source
stringlengths
0
47
title
stringlengths
0
100
description
stringlengths
0
502
date
stringlengths
0
20
headline
stringlengths
0
113
content
stringlengths
0
9.43k
tags
sequence
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44409687
Ụgbọelu Osinbajo enweela nsogbu n'elu
Yemi Osinbajo hapụrụ ụgbọelu ya na Gwagwalada ụnyaahu ka achọpụtara na o nwere nsogbu.
2018-06-08T06:18:38Z
Ụgbọelu osote onyeisiala enweela nsogbu n'elu
Yemi Osinbajo na Abuja Osinbajo jiri ụgbọala laa ka ọ kagburu njem ya. Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo gbanahụrụ ọdachị ụnyaahu ka ụgbọelu bu ya ga-ụlọakwụkọ akpọrọ Nigerian Customs Command and Staff College nke dị na Gwagwalada nwere nsogbu n'elu. Ụgbọelu a, bụ nke a na-akpọ "helicopter" ebuchịghị ya azụ n'Abuja. Ụgbọelu akụriela n´ụzọ Moscow Ndị njem ụgbọelu atọla taa Ụgbọelu bu mmadụ 60 akpọkasịala Osinbajo gara ụlọakwụkwọ Customs ahụ bụ ebe a na-azụ ndị ọrụ ngalaba na hụ maka ụtụisi na ngwa ahịa na-abata Naịjirịa. Osinbajo na ndị pụtara na-agụmakwụkwọ sere foto tupu ọ gawa ebe ụgbọelu ya dị, mana ka ụgbọelu ahu fepụrụ, achọpụtara na-ụme adịghịzị ya ị naru. Osote onyeisiala mechara jiri ụgbọala lawa, ka ahapuru ụgbọelu ahu ebe ahụ. Onye mgbasa ozi Osinbajo bụ Laolu Akande kwuru na ọ bu ihe mebiri na ya bụ ụgbọelu mere osote onyeisiala jiri hapụ iji ụgbọelu ya la. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mee Humphrey Nwosu ka ibe ya - Chewas Okorie Gịnị mere ụmụnwaanyị ji eghe ntutu? GTB asaala akụkọ gbasara ikpe Innoson
[ "Naijiria", "Mberede njem ụgbọelu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44422952
APC adọọla Okorocha aka na ntị
Pati na-achị si na Okorocha kwesiri isoro usoro di na iwu ji APC gosi iwe ya na ebe ochere na-emeidere ya.
2018-06-09T06:01:19Z
APC agwala Okorocha ka ọkwụsị ebo ndị isi ha ebubo
Owele Rochas Okorocha Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo Otu ndọrọndọrọ na-achị bụ All Progressives Congress (APC) adọla aka na-achị Imo steeti bụ Owelle Rochas Okorocha aka na ntị maka ebubo ha si na ọ na-ebo ndị isi otu pati ahụ. Okorocha kwuburu na onye isi oche APC bụ John Odigie-Oyegun akwanyeghị iwu ọlụikpe nyere banyere ntuliaka a ga-eji họpụta ndị ga-achị pati ha na onye ga-azọrọ ha ọchịchị n'Imo. N'akwụkwọ Bolaji Abdullahi bụ ode akwụkwọ mgbasa ozi nke APC dere, APC kọwara ebubo Okorocha boro ha ka ihe enweghị ụkwụ ọbụla, ma kwuo na ha enweteghị akwụkwọ si ụlọ iwu maka ị kwụsi ntuliaka ahụ. Okorocha esoghi na nzụko ndị isi APC mere Okorocha ọ pụrụ imeli ọgọ ya Gọvanọ Imo steeti? Ọkụ ụlọọrụ APC: Ọ bụ PDP mere ihe a - Onwuemeodo Abdullahi kwuru "N'ịza ebubo aka na-achị Imo boro Oyegun na "ọkwanyeghị ụlọikpe ugwu" eziokwu adịghị na ya. "Maka nke a, anyi na-agwa gọvanọ Imo ka ọkwụsị ebo ụdịrị ebubo a maka na ha abụghị eziokwu. Na-ime ntuliaka a na gbụrụgbụrụ Naịjirịa, na ị nyocha ha n'otu n'otu nakwa idu ndị ga-achi pati na steeti dị icheiche n'ịṅụ iyi, ndị na-ahụ maka ya bụ "National Working Committee" (NWC) soro usoro na iwu pati," Akwụkwọ mgbasa ozi a kwuru. APC gara n'ihu nye Okorocha ndụmọdụ ka osoro usoro iwu ha kpesa nsogbu ọ bụla maọbụ ụzọ ọbụla esi megide ya. Cheta na Okorocha na ụfọdụ ndị APC n'Imo steeti nwere nsogbu maka etu esiri mee ntulika iji họpụta ndị ga-achị pati ahụ n'Imo nakwa nkwado ọ na-enye ọgọ ya nwoke ị bụrụ aka ga-achị Imo ma ọ rituo. Lee ihe ndị kpọrọ onweha "Restoration Group" kwuru maka ntuliaka a na Okorocha mgbe ha mechara nzụkọ n'Abuja n'ọnwa gara aga.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "All Progressives Congress", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44422954
Naịjirịa ga-ere akụnaụba ọha
Ngalaba na-ahụ maka akụnụba ọha nke Naịjirịa ekwuola na ha ga-ere akụnụba ruru ijeri naịra 400 maka bọjetị 2018.
2018-06-09T08:42:45Z
Naịjirịa ga-ere akụnaụba ọha iji mezuo ego bọjetị 2018
Igwe ọkụ latrik Ngalaba ọkụ latrik so na ndị a ga-etinye n'ahịa Naịjirịa na-ele anya na ọ ga-erete ijeri naira 400 na akụnụba ọha nke ga-enye aka tinye ego na bojeti nke 2019, onyeisi ngalaba na-ahụ maka akụnụba ọha kwuru. Alex Okoh, onyeisi ngalaba ahụ akpọrọ "Bureau of Public Enterprises" n'asụsụ bekee, kwuru na gọọmentị ahazịela usoro atụmatụ ha ga-eji ree akụnụba gọọmenti, bụ nke ha jiri bụte ego n'aka ulọakụ mba ụwa. Ego a ha bụtere ga-abanye ibulite nkekọrịta ọkụ latrịk, bụ nke ha sị adịghị eme ọfụma. Ụlọomeiwu ejirila N500bn bulite bọjeti Enugwu steeti ekewapụtala ijeri naira 103 maka 2018 Bọjetị 2018 ọ ga-enyere ndị ntoroọbịa aka? Na mkparịtaụka Okoh na ụlọ ntaakụkọ Reuters nwere na izuụka gara aga, ọ gwara ha na gọọmentị Naịjirịa nwere atụmatụ ire maọbụ inye ụlọ ọrụ ndị nkịtị ihe dị ka ọgbọ egwuregwu na ụlọ ọkụ latrịk. Ndị Reuters nwere na gọọmentị gwakara ha na achọrọ iresi ọha ụfọdụ oke gọọmentị nwere na ụlọọrụ Nigerian Reinsurance Company n'ọnwa Novemba nke afọ a. N'afọ 2013, Naịjirịa bidoro ire akụnụba ọkụ latrịk ya n'uche na ọ ga-enye aka ime ka me ka ọkụ na-adị karịa ka ọ na-adị na mbụ ma webata ego si mba ofesi, mana onweghị otu n'ime ihe mere. Okoh kwuru na ngalaba ọkụ latrịk so n'ime ngalaba 37 ọha erere eritebeghị uru ekwesiri na ha, mana o kwughi akụnụba ole gọọmentị rere. Ọ gakwara n'ihu kwuo na Naịjirịa alabatala ego ruru ijere dọla 7.8 site n'ake ndị mba ofesi ji ego achụ ego. Buhari ebinyebeghị aka n'akwụkwọ eji eke ego nke 2018, bụ nke ga-eme ya iwu. Bọjetị Naịjirịa riri elu karịcha kemgbe Buhari batala ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mee Humphrey Nwosu ka ibe ya - Chewas Okorie Gịnị mere ụmụnwaanyị ji eghe ntutu? GTB asaala akụkọ gbasara ikpe Innoson
[ "Naijiria", "Ahịa", "Ike" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44446388
Gịnị mere bọọlụ ụmụnwaanyị anaghị amasị gi?
Super Falcons bụ otu ama ama na Afrika dịka ndị na-agba nke ọma mana ọtụtụ mmadụ anaghị e kiri a.
2018-06-11T18:09:49Z
Gịnị mere bọọlụ ụmụnwaanyị anaghị aga ahịa na Naịjirịa?
Super Falcons Super Falcons eburuola iko mba Afrika ugboro iri Egwuregwu bọọlụ bụ egwuregwu nwere ọtụtụ mmadụ ọ na-amasị na Nịjirịa na kwa n'ụwa niile. Ugbua, asọmpị iko mba ụwa bụ nke na-akpọtụ akpọtụ nke ọma makana ọ ga-ebido n'ụbọchị atọ na-abịa, mana ajụjụ anyị na-ajụ n'akụkọ a bụ: gịnị mere egwuregwu bọọlụ gbasara ụmụnwanyị anaghị enwe mmasị dịka o kwesiri ị nwe? Ị ma ụmụnwaanyị ji ndị Super Eagles n'ọrụ? Jiri ihe egwuregwu BBC News kaa onye ga-emeri n'iko mba ụwa 2018 Ka anyị leebe anya n'otu Super Falcons. Taa, Super Falcons meriri Queen Scorpions nke Gambia ọkpụ isii na asataghị ihe n'agba nke abụọ n'itozu n'isonye n'asọmpi iko mba Afrịka nke ụmụnwaanyị. Super Falcons anaghị irete uru ka ndị Super Eagles Cheta kwa na Falcons ebuliela iko a ugboro iri kamgbe e ji malite emume a. Mana ruo ugbua, ọtụtụ mmadụ anaghị e kiri egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị dịka a esịrị tụ anya. BBC Igbo jụrụ ndị bọọlụ na-amasị ajụjụ ọnụ gbasara okwu a. Gịnị mere ọtụtụ mmadụ anaghị ekiri bọọlụ ụmụnwaanyị? Chisom Mbonu-Ezeoke bụ nwaanyị egwuregwu bọọlụ na-amasị nke ọma. O kwuru na ọ bụ makana gọọmentị anaghị etinye ego n'egwuregwu a. Super Falcons bụ ndi nọ n'isi egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị n'Afrịrịka O kwukwara na ndị ntaakụkọ anaghị agbasa ozi gbasara egwuregwu bọọlụ nke ụmụnwaanyi ka ha kwesiri ịme. Mana Kenneth Umerue kwuru na ọtụtụ ụmụnwoke anaghị ekiri egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị makana n'ụche a egwuregwu a bụ nke nwoke. Umerue kwuru na "Ndị bekee kpọrọ ihe a 'Gender Issues'". Mana Mbonu-Ezeoke ekwetaghị n'okwu nke a. O kwuru na "ị lee anya oge ọbụla ndị Super Falcons na-agba agba nke ịkpeazụ, ọgbọ egwuregwu na-eju gbọm!. Nke a gosiri na egwuregwu a na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ" Stephen Mbonu kwetala na ihe a Mbonu-Ezeoke kwuru, mana ọ dọrọ aka na ntị sị: "oge eruola ịchọpụta ọtụtụ ụmụnwanyị nwere ike ị gba bọọlụ ọfụma ọfụma. Ihe a ga-eme ka mmasị egwuregwu a na-eto oge ọbụla." Akụkọ ga-amasi gị: Amabeghị ezinaụlo mmadụ 7 nwụrụ n'ụzọ Onicha -Uweojii Ọgbakọ G7: "Onye zụrụ nwaanyị zụrụ obodo" 'Ndị mmadụ kọrọ m ọnụ nwa' - Nne ejima atọ
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44446993
"Amaghị m ebe nwa m dị afọ abụọ nọ kemgbe Mee 1"
Nne nwa dị afọ abụọ furu kemgbe Mee 1 na-ayọ ọha enyemaka ịchọta nwa ya enyi nwaanyị onye agbataobi ha kpọrọ pụọ kemgbe ụbọchị mbụ nke n'ọnwa Mee.
2018-06-12T13:07:06Z
"Enyi nwaanyị onye agbataobi anyị kpọrọ ya pụọ"
Nne nwa afọ abụọ furu kemgbe Mee 1 na-ayọ ọha enyemaka ịchọta nwa ya. Kamgbe ahụ ezinaụlọ nọ na nnukwu nwute gbasara ọfufu nwa ha. Ndị ụweojii BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ na-ekwu na ha anwụchiela mmadụ abụọ bụ enyi nwaagbọghọ nwa ha furu n'aka ya.
[ "Naijiria", "Ụmụaka", "West Africa", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44450021
World Cup 2018: Falcons na-ekpere Super Eagles ekpere
Nwa agbọghọ na-agbara Super Falcons bọọlụ bụ Ugochi Desire Oparanozie ekwupụtala nkwado ya n'ebe ndị Super Eagles nọ.
2018-06-12T13:20:51Z
World Cup 2018: Falcons na-ekpere Super Eagles ekpere
Nwa agbọghọ na-agbara Super Falcons bọọlụ bụ Ugochi Desire Oparanozie ekwupụtala nkwado ya n'ebe ndị Super Eagles nọ. Na ngwụcha asọmpi ha na ndị Gambia ụnyaahụ ebe ha ji ọkpụ goolu isii a na-asataghị otu merie, Oparanozie gwara BBC Igbo na obi dị ya ụtọ inye goolu anọ n'ime egwuregwu ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ maara na ndị Super Eagles ga-eme nkeọma n'asọmpi Iko Mbaụwa. Oparanozie kpeere ndị Super Eagles ekpere ọganihu. Naịjirịa ji nchịkọta ọkpụ asaa asataghị otu merie ndị Gambia iji tozuo oke n'asọmpi Iko mba Afrịka a ga-agba na Ghana n'afọ a.
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Bọọlụ", "Iko mba ụwa", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/44499680
Akụkọ kachasị n'abali a: Trump na China na-ama aka n'ihe gbasara azụmahịa
O teela Trump na China na-akwata onye ọ ga anara dịka ọ siri gbasa nzụrịta ahịa mba abụọ ahụ.
2018-06-15T18:02:51Z
Akụkọ kachasị n'abali a: Trump na China na-ama aka n'ihe gbasara azụmahịa
Akụkọ kachasị mere taa; E mewaala ndị Ijipt obi Mohamed Salah gbajiri aka ka otu egwuregwu Liverpool na Real Madrid zutere n'asọmpi ngwụcha Champions League tupu Iko Mbaụwa ebido Ndị Ijipti ebeela akwa arịrị ka ndị mba Yuregụaị meriri ha n'asọmpi abụọ nke Iko Mbaụwa a gbara taa. Onye egwu bụ Jose Gimenez nyere goolu na nkeji iri itoolu, mewara ndị Ijpti obi ma mee ka ọtụtụ buru aka n'isi. World Cup 2018: Salah Ebee ka Gimenez gbakara neetị ha World Cup 2018: Lee mmemme niile mere na mmepe Iko mba ụwa taa Ọkaiwu Evans eserela aka Chukwudumeme Onwuamadike ama dịka Evans bụ onye a na-enyocha maka ntọ ndị ji ego na Naịjirịa Akụkọ anyị na-anụ ugbua bụ na Olukoya Ogungbeje bụ onye ọkaiwú Chukwudumeme Onwuamadike nke a ama dịka 'Evans' bụ onye a na-enyocha maka ịtọ mmadụ, esila n'ihe gbasara okwu ya sepụ aka. N'ime akwụkwọ Ogungbeje depụtara, o kwuru na ọ bụ maka ebumnuche ihe gbasara ya ka o ji mee nke a. Onye ọkaiwu Evans esepụla aka n'ikpe ya E bugoola ndị uweojii 45 maka nwụchi Evans Trump na China a na-ese okwu? Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ ga-atụkwasị ego ụtụ ruru pasentị iri abụọ na ise n'elu ngwaahịa ndị si China. O kwuru nke a ka ọ na-ebo ndị Beijing ebubo maka izu ihe mmepụta ọnatarachi nke bekee 'intellectual copyright theft'. Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Trump na Kim ezutela Trump na Kim a ga-ekwe n'aka nke udo? Ndị Naịjịrịa chọrọ ịnwụ ọkụkọ gaa Rọshịa Mba Rọshịa machiri ndị nkwado otu Super Eagles chọrọ iji ọkụkọ gaa n'ama egwuregwu maka asọmpi Naijiria nwere na ngwụcha izu a. Cheta n'asọmpi iko mbaụwa nke afọ 2010 nke mere na Saụt Afrika, a machiri ndị nkwado Super Eagles iji ọkụkọ e tere uhie njirimara Naijiria n'ahụ banye amaegwuregwu Ellis Park dị na Johanesbọg maka asọmpi ha na Agentina. World Cup: Ezi 'na-ahụ ụzọ' ekwuola na Super Eagles ga-eru ọkara-ikpeazụ Họrọ ndị ọgba bọọlụ Afrịka kacha masị gị Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Lee ihe nkiri taa
[ "Naijiria", "Bọọlụ", "Iko mba ụwa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44510819
Ị mana ndị nna na-eme ngoli?
Taa bụ ụbọchi emume ncheta ndị nna n'ụka Anglịkan na mbaụwa niile. BBC Igbo gara ijụta ndị mmadụ ihe puru iche na-ebe nna ha nọ.
2018-06-17T17:27:53Z
Gwa anyị ihe mere nna gị ji pụọ iche tunyere nna ndị ọzọ?
Ndị nna bụ ide ji ụlọ. O nwere ihe puru iche iji echeta nna gị ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ? Kirie ihe onyonyo a ka i hụ ihe ndị mmadụ sara ma gwa anyị nke gị. Akụkọ ndị ga-amasị gị:
[ "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44544319
Ụzọ 6 gọọmenti ji chọọ igbo mkpa ndị ọchịehi
Gọọmenti etiti ewepụtala atụmatụ iji kwụsị nsogbu ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo kpam kpam.
2018-06-20T06:13:18Z
Ụzọ 6 gọọmenti ji chọọ igbo mkpa ndị ọchịehi
Ehi Nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo na-emetụta ikọpụta ihe oriri Nsogbu dị n'etiti ndị ọrụugbo na ndị ọchịehi ataala isi narị puku mmadụ na steeti dị icheiche Naịjirịa. Ọtụtụ narị mmadụ anwụọla kamgbe ọnwa Jenuwarị afọ a bụ 2018 na ya bụ ọgbaghara na-eme na steeti Benue, Platu, Kadụna na ebe ndị ọzọ dị na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nakwa na mpaghara ọdịda anyanwụ. Atụmatụ ọhụrụ gọọmenti etiti wepụtara bụ nke ha kpọrọ 'National Livestock Transformational Plan' na Bekee bụ onye ndụmọdụ otu na-eleba anya na akụ na ụba obodo bụ 'National Economic Council' bụ Andrew Kwasiri wepụtara ya ụnyaahụ n'Abuja. Ndị ọchịehi awakpola Akure South Gụọnụ ndị ọchịehi ndị oyiegwu -Ụlọomeiwu 'Kwụsị ime ndị ọchịehi ka ụmụnna gị' Ndị nọ ngosi ya bụ atụmatụ bụ mịnịsta ọrụụgbo bụ Audu Ogbeh na aka na-achị Benue steeti bụ Samuel Ortom. Atụmatụ isii ahụ bụ; Itinye ego irite uru: Nke a bụ nke ha kpọrọ 'Economic Investment' na Bekee. Nke a bụ itinye ego ikwalite ebe a na-azụ ehi nke ga-aga ahịa na steeti asaa na Naịjirịa a ga-eji bido ya iji hụụ na a kwalitere ịchịehi nakwa ihe ndị ehi na-emepụta. Ha etinyekwa anya na ikwalite ụdị ehi a na-achị site na itinye nke e ji sayensị hazie ma mezikwa ala dị mma nakwa mmiri ha ga-eji na-azụ ehi ha Ikpe udo: Gọọmenti kwuru na ha ga-ewugharị ntukwasị obi dị n'eiti ndị ọrụugbo na ndị ọchịehi site n'ikwalite obodo dị icheiche ebe ndị ọchịehi ahụ nọ ka e nwekwaike nwee udo tọrọ atọ n'etiti ha Iwu na usoro: A ga-eguzobe iwu na usoro ga na-edu ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo nke ga-ahụ maka etu ndị ọchịehi si achị ehi ha. A na-elekwa anya na nke a ga-ewetakwa udo Enyemaka Ikwalite obodo: Nke a bụ iji wugharịa ihe ndị ọchịehi mebisiri n'obodo ndị ahụ ha wakporo na mbụ, dịka ụlọ ndị mmadụ, ụlọụka, ụlọọgwụ, ahịa na ihe ndị ọzọ Mgbasaozi na agụmakwụkwọ: Atụmatụ nke ise a bụ iji kwalite mgbasaozi gbasara ikwalite ịchịehi na-etu a ga-esi wulie ebe a na-achụehi na steeti ndị ahụ nakwa ịkwụsị nsogbu ndị na-apụa n'etiti ha dịka igbu mmadụ, imebi ihe gụnyere ụlọakwụkwọ Nleta na nyocha: Nke a bụ nke a ga-eme iji hụụ na atụmatụ ndị ọzọ na-aga etu o si kwesi na ịchọpụta nsogbu ndị nwereike ime na ọ gaghị nke ọma. Ọchịehị nabata nụ mkpapụta ala - Ugwuanyi Ndị Benue apụtaghị nabata Buhari Ghọta nụ na m na-arụ ọrụ - Buhari Steeti ebe atụmatụ ndị a ga-ebido Ọtụtụ ehi na-agagharị n'ime obodo Enugu Atụmatụ ndị a agaghị amalite na steeti niile na Naịjirịa, e nwere steeti ndị ga-amalite ya tupu ndị ọzọ esonye ha. Steeti ndị ahụ bụ; Adamawa Benue Ebonyi Edo Kadụna Nasarawa Ọyọ Platu Taraba na Zamfara Atụmatụ a gụnyere imebe ebe a na-azụ ehi na steeti ndị ahụ. Plateau: Ndị ọchịehi egbuola mmadụ 25 Ụka Metọdist: Kpọọ ndị ọchịehi 'ndị oyiegwu' Akụkọ kachasị n'abali: Buhari akatọọla ndị ọchịehi N'okwu ya, Kwasari bụonye gosipụtara atụmatụ a kwuru; "E sepụtala ụdị ebe a na-azụ ehi nke ayị gosiri gọọmenti nke gụnyere etu ha ga-adị na etu ha ga-aha na steeti iri ndị ahụ.'' "Gọọmenti na-ele anya ịkwụsị nchụgharị ehi ma mee ka ha nọrọ otu ebe ka a kwụsị nsogbu ndị ọchịehi na na ndị ọrụugbo na-enwe maka na ha na-azọ otu ebe.'' "Ebe a ga-arụ maka ehi nwere ndị ga-eri ehi mkpụrụ 30, 40, 150 rue 300 nke a ga-arụ na-ebe steeti ahụ nyere ala mana ọ ga-abụ o pekatampe mkpụrụ ehi 1000 ga-dị n'otu ebe n'ime steeti iri ahụ." Amabeghi etu ihe a ga-esi rụọ ọrụ rue mgbe o bidoro. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Anambara esonyela na steeti na-eme mmanu Nkwa asaa Buhari kwere na ihe o mere Ipob: Mpụtagharị Buhari ga-enye anyị Biafra
[ "Kaduna", "Adamawa Steeti", "Kaduna steeti", "Zamfara Steeti", "Plateau steeti", "Edo Steeti", "Benue steeti", "Ebonyi Steeti", "Ọyọ steeti", "Taraba steeti", "Nasarawa steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44559059
Amerịka achụlatala ụfọdụ ụmụ Naịjirịa
Mgbachị oke ala ndị Amerịka na-eme emetụtala ndị Naịjirịa ka mmadụ ha chụlatara rutere ọdọụgbọelu MM@ na Legos ụnyaahụ.
2018-06-21T07:56:43Z
Amerịka achụlatala ụmụafọ Naịjirịa ruru 34
ndị mbịambịa E sikwa mba Libya chụlata ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na mbido afọ a Opekatampe mmadụ 34 bụ ụmụ Naịjirịa ka ndị Amerịka chụghachitere Naịjirịa maka na ha kpara arụ n'obodo ahụ. Ndị ahụ achụlatara gụnyere ụmụnwoke mmadụ 32 na ụmụnwanyị abụọ. Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii n'ọdọ ụgbọelu Legos steeti bụ Joseph Alabi kwupụtara nke a nye ndị ntaakụkọ. O kwuru na mmad 25 n'ime ndị kpara arụ gbasara ọgwụike ebe ndị ọzọ dara iwu gbasara ndị mbịara mbịara. Mmadụ 136 esịla Libya laghachịte Agbapụtala mmadụ iri ise na mmiri Ndị na-ere mmadụ atọọrọla ụmụakwụkwọ na Benin Alabi kwuru na ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Naịjịrịa bụ Nigerian Immigration Service (NIS) na Bekee na ndị na-ahụ maka ịkwụsị mgbere mmadụ a na-akpọ National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons na ndị uweojii bụ ndị nabatara ndị ahụ achụlatara. Ndị ọrụ njem ụgbọelu nọkwa ebe ahụ soro nabata ha nakwa ndị na-ahụ maka ịkwụsị ibubata na ibupu ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug and Law Enforcement Agency. O kwukwara na otu ndị ahụ dị icheiche debere aha ndị ahụ n'ebe di icheiche tupu e bulaa ha n'ebe ha ana-aga. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ụmụnwaanyị Abịa achọghịzị mgbere nwa na akwụna cha cha Ụzọ 6 gọọmenti ji chọọ igbo mkpa ndị ọchịehi Ipob: Mpụtagharị Buhari ga-enye anyị Biafra
[ "Naijiria", "Njepụ", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44565371
Amachiela iri anụ nkịta
Ndị na-azụ nkịta na Saụt Koria ekwuola na ha ga-amanye gọọmentị ọgụ maka iwu e tinyere imachi ndị mmadụ ịta anụ nkịta.
2018-06-21T17:34:17Z
Ndị Kọrịa sị na iwu jizi iri anụ nkịta
Ndị Saụt Koria na-eri ihe ruru nkịta nde kwa afọ Ndị Saụt Koria na-eri ihe ruru nkịta nde kwa afọ Ndị ụlọikpe dị na Saụt Koria enyela iwu imachi ndị mmadụ igbu ma rie anụ nkịta. Ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụ anụmanụ kwuru na iwu a ụlọikpe tinyere ga-emepe ohere ndị mmadụ ga-eji na-ata anụ n'ụzọ na-ezighị ezi. O teela ndị Saụt Koria ji bido ịta anụ nkịta, nke mere ha na-eji eri ihe ruru nkịta nde kwa afọ. Nwamba ọ bụ amusu n'ezie? Ihe kachasị mkpa ịma maka arụ agwọ Mana ugbua, ọtụtụ n'ime ha ebidola ịghọta na nkịta bụ ezigbo enyi mmadụ, mere ka ha wetuo aka n'etu ha si eri anụ nkịta. N'afọ gara aga, ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụ anụmanụ tinyere akwụkwọ maka otu onye na-azụ nkịta n'ime Bucheon, onye ha kwuru na "ọ na-egbu ụmụanụmanụ etu ọ masịrị ya" ma na-ada iwu gbasara ịdị ọcha. Anụ nkịta so na nri e ji mara ndị Saụt Koria nke ha bidoro iri oge Samkuk (oge ha ka bụ obodo atọ BC 57 - AD 668) Ndị na-agba akwụkwọ mechara gbaa onye ahụ na-azụ nkịta akwụkwọ, ndị ụlọ ikpe Bucheon City mara ya iwu ma gwa ya kwụọ $2,700. Ọkaiwu Kim Kyung-eun gwara ndị ntakụkọ AFP na ihe ikpe ndị ụlọikpe nyere masịrị ya. "Ọ dị mkpa makana ọ bụ iwu mbụ ụlọikpe na-enye na-ekwu na igbu nkịta maka anụ ya bụ ihe megidere iwu. "Ikpe a emepeela ụzọ maka ịmachi iri anụ nkịta chaachaa." Ndị na-azụ nkịta kwuru na ha ekweghị na mmachi gọomentị machiri ịta anụ nkịta Otu onye na0-anọchite ndị na-azụ nkịta bụ Cho Hwan-ro kwuru sị ka gọọmentị mee ka iri anụ nkịta ghara ịbụ ihe e ji ada iwu. O kwukwara na ha ga-amanye gọọmentị ọgụ ruo na ngwụcha ma ọ bụrụ na ha emeghị nke a. Cho kwuru sị ka e kewaa ha n'ime "nkịta a na-azụ maka oriri na nke e ji eme enyi" maka na ebumnobi ha ji azụ nkịta ndị a dị iche, nke pụtara na nri e ji azụ ha dị iche ebe nkịta ndị a dịkwa iche iche. "Ndị mmadụ na-azụ ehi, ezi, ọkụkọ na ọbọgwụ, kedụ nke nkịta ji pụọ iche?" Ndị na-azụ nkịta na-eji ebe ha bi mere ebe ha na-egbu nkịta, maka na gọọmentị enyeghị ndị na-egbu anụ akwụkwọ ikike igbu nkịta. Anụ nkịta na Naịjirịa Abịa na Naịjirịa, enwere ndị na-ata anụ nkịta, mere na e nwere ahịa a na-akpọ Dawaki dị na Plateau steeti bụ ebe a na-ere anụ nkịta. Ụfọdụ ndị na-ego ya ma ree ya n'ụlọ oriri ha, ebe ndị mmadụ na-ego ya ma jiri mmanya ọkụ butuo ya. A na-erekwa anụ nkịta n'ahịa Ushafa dị na Bwari n'Abuja, ebe ndị ọkwa ha gbagotere na-abịakwa agba ha aka ahịa. E nwere ụfọdụ ndị na-eri anụ nkịta na Naịjirịa Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndigbo akatọọla atụmatụ ọgba ehi Lee ụmụnne abụọ na-eji akpụ emepụta ọkụ latrik na Gana
[ "Anụmanụ", "Naijiria", "Ndịda Korea", "Ikike dịrị anụmanụ", "Ọdịmma anụmanụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44572706
Ihe mere eji kpụpụ nwunye onyeisiala mba Izrel nọ n'ụlọikpe
Sara Netanyahu ga-aga ụlọikpe ga zara ọnu ya maka ebubo na o ji ego ọha zụọ nrị etu ekwesighị ekwesị.
2018-06-22T07:23:52Z
Gini mere Izrel ji kpụpụ nwunye Netanyahu ụlọikpe?
Netanyahu na nwunye ya. Ebubo kwuru na nwunye Netanyahu zuru nrị na esi ebe obi di ya nwere onye osi nri Ndị uweojii n'Izrel akpụpụla nwunye onyeisiala ha bụ Sara Netanyahu ulọikpe maka ebubo mpụ na mmerụaka e boro ya. Ebubo a na-ebo nwunye Netanyahu gbasara iji dọla narị puku jiri zuo nrị n'obi onyeisiala Izrel etu o kwesịghị. Nsogbu a Sara Netanyahu nwere bụ otu n'ime nsogbu ezinaụlọ ha na-enwe kemgbe ndị nyocha bidoro itinye anya n'etu ha jiri mefuo ego ọha. 'Israel na-emegide ụka Kraist' Onyeisiala mba Israel ewela ebubo mpụ Ụlọịkpe Israel akwụsịla ndị mbịambịa n'ike Ngalaba na-ahụ maka ikpe n'Izrel kwuru na ọ bụ onye na-ahu maka ikpe ọha na Jerusalem tinyere akwụkwọ gbasara Netanyahu n'ụlọikpe. Ngalaba ahụ kwuru na Sara, dị afọ 60, tụrụ asị mgbe o kwuru na ndị na-esi nrị anọghị n'obi Netanyahu, nke mere o jiri zụọ "nrị n'akpa ọha". Ha kwuru na site n'afọ 2010 ruo afọ 2013 Netanyahu, na ndị be ya nakwa ndi ọbịa ha, jiri "aghụghọ nata nrị narị kwa narị a na-eche ruru dọla otu puku narị." Nwunye Netanyahu, bụ onye a ma ama dika onye na-akwado di ya kemgbe ọ nọ n'ọchịchị, kwuru na onweghi ihe ekwesighi ekwesi ya mere. Ndị okaiwu ya, n'ime ozi ha zipuru, katọrọ ebubo a, ma kwuo na o bụghị Netanyahu zụrụ nri ndị a, nke ha sị na ụfọdụ n'ime ha bụ nke e nyere ndị ọbịa pụrụiche. Na nkọwa akwụkwọ e ji hazie ebubo a, a zụtara nrị ndị a na-ese okwu n'ụlọnrị aha ha na ada ụda ọfụma. Akụkọ ndị ga-amasị gị: World Cup 2018: Messi ebee ka Kroeshia gbara ha 3-0 iji gosi ha nkarị El-Zakzaky: Ndị Shi'ite egbuola otu onye uweojii na Kadụna Ọljiria gbachiri ịntanet iji gbochie aghụghọ n'ule
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Israel na ndị Palestine", "Mpụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44584202
Bia hụrụ nwoke ka nwaanyị esi ofe onugbu
Onugbu a dị iche n'ihi n'ọbụ nke ndị na-achọ nrị enweghị nnukwu mmanụ ma na-enye ihe dị nma na-ahụ.
2018-06-22T18:34:14Z
Osite Yoroba siri onugbu
Kolawole Dosunmu a ma dịka 'KD Prime' bụ nwoke ị sị nrị na-amasị. O siere BBC Igbo ofe onugbu pụrụiche ya bụ nke ejighị 'Maggi' na obere mmanụ nrị were sie. Akụkọ ga-amasị gị: Ọrụ a si n'aka Jessica Nwankwo
[ "Naijiria", "Nri" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44586445
Ndị isi mba Afrịka abụọ ezerela ogbunigwe gbara na nzukọ
Onyeisiala Ethiopia bụ Abiy Ahmed zere ogbunigwe na Addis ka Emmerson Mnangagwa zere nke atụru na Bulawayo.
2018-06-23T13:13:12Z
Ndi isi mba Afrịka abụọ ezerela ogbunigwe gbara na nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị
Ndị isiala mba Afịrịka abụọ zere ogbunigwe tata ka nzukọ ndọrọndọro ọchịchị Emmerson Mnangagwa gara yasara ka ogbunigwe gbara n'ebe ahụ ka aka nọ na-ekwu maka nke mere na isi obodo Etiopia bụ Addis Ababa ebe onyeisiala ha bụ Abiy Ahmed na ndi nkwado ya nọ na nzụkọ. Ihe nkiri si Bulawayo na egosiri na ogbunigwe gbara na ọgbo egwuregwu akpọrọ "White City Stadium" ka Mnangagwa na-akwado ịhapụ ka ọ gwachara ndị nkwado ya okwu. O merụhụ ahụ, mana osote onyeisiala Zimbabwe na ndi ọzọ ọkwa ha gbagotere n'ọchịchị Zimbabwe sọ na ndi merụrụ ahụ. N'Etiopia, akuko ọhụru na-erụ anya nti na-akọwa na otu onye nwụrụ site na ogbunigwe a gbara. Ndị ọrụ gọọmentị n'Itiopịa kwuru na ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ ka a tụrụ ogbunigwe ebe ndị na-akwado Abiy Ahmed, bụ onye ndọrọndọro ọchịchị, na-eme nzukọ. Ebe ogbunigwe a gbara, ka ọ ka mechara Ahmed kwuburu na ọtụtu mmadụ nwụrụ, ma kọwakwaa na ihe a mere bụ mkpamkpa apụtaghị ihe si n'aka "ndị na-achọghị ka Itiopịa dịrị n'otu". A kpọpụrụ Abiy ozugbo ogbunigwe a gbara. Onyeisiala mba Ethiopia arituola n'ọkwa Mba Amerịka, UK na Fransị awakpola Sirịa Kenya: Awakporo Kalonzo Musyoka A na-eche na ogbunigwe siri n'ihe ndi Bekee kpọrọ "grenade" atụbara n'ime mmadụ puku na puku nọ n'ọgbọ Meskel nke dị n'isi obodo Itiopịa bụ Addis Ababa. Aka ikenga Ahmed bụ Fitsum Arega, sị na mmadụ 83 merụrụ ahụ n'ihe a mere, ebe nke mmadụ isii n'ime ha dị ezigbo njọ. Abebaw Bekele, bụ onyeisi ndị otu gbatagbata Red Cross n'Addis Ababa, kwuru na ha ezipụla ụgbọala "Ambulance" 13 gawa ibute ndị ihe metụtara. Mmadụ puku kwa puku bịara nzukọ a Ha zigakwara ndị ọrụ gbatagbata 80 na ndị nọọsụ anọ. Bekele kwuru na ozi ya nwetara kwuru na mmadụ 100 merụrụ ahụ mgbe ogbunigwe ahụ gbara. Onyeisi oche ndị hazịrị nzụkọ a gwara BBC na anwụchịrị ndị mmadụ bu ogbunigwe n'ime akpa. Okwuru na ha nọ n'aka uweojii ugbua. O kwukwara na ha na-eche na enwereike nwe ebe ọru ndi nchekwa siri gba ọrụ. Na Zimbabwe, amabeghi mmadu ole merụru ahụ mana ndị ntaakụkọ na-akọwa na onwereike bụrụ na-etinyere ogbunigwe a n'okpuru ebe ndị nwere isi nọ. Akụkọ ga-amasị gị: World Cup 2018: Ugo Naịjirịa efeliela ọzọ Ihe ihere ji kwesị ime ndi omeiwu Igbo: Chekwas Okorie Kedụ nwa afọ Igbo ahụ Buhari mere otu n'ime ndị isi CBN?
[ "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Ethiopia" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44588603
APC National Convention: A kụwara mmadụ atọ isi
N'ọgbakọ ndị APC mere iji họpụta ndị ga-achị ha afọ anọ, ndị mmadụ chọrọ ịji ọgụ lụsaa nzukọ a.
2018-06-23T14:49:52Z
APC National Convention: A kụwara mmadụ atọ isi
Onyeisiala Buhari N'agbanyeghị na ndị ọrụ nchekwa gbara ogige ebe a na-eme ọgbakọ ndị APC gburugburu, ọgụ dara n'etiti ndị mmadụ bịara ọgbakọ a. Onye nta akụkọ BBC kwuru sị na ndị si Imo steeti bidoro ịlụ ọgụ; ọgụ dị n'etiti ndị kwadoro Gọvanọ Rochas Okorocha na ndị kwadoro osote ya bụ Eze Madumere. Ka ndị nchekwa tinyere aka igbosa ha, ndị si Delta bidoro ịlụ ọgụ nke ha. Ndị na-akwado Otega Emerhor na Victor Ochei bidoro ịlụso ndị na-akwado Sinetọ Ovie Omo-Agege ọgụ, nke butere nkụwasị oche nakwa nkụwa isi mmadụ atọ. Mmadụ abụọ anwụọla na ntuliaka APC A nwụchiela mmadụ anọ maka izu akwụkwọ ntuliaka APC Ntuliaka imeụlọ APC: Gịnị ga-eme ugbua? Ka a jụrụ ha ihe kpatara ọgụ a, ha kwuru na Omo-Agege ji ọkwa ya na-akpọbata ndị na-abụghị ezigbo ndị nnọchiteanya. Ndị uweojii mechara kwụsị ọgụ a. Cheta na-akpọpụtara onye bụbụ aka na-achị Edo steeti bụ Adams Oshiomhole dịka onyeisioche APC ka ndị ya na ya na-azọ oche rituru n'ụbọchị Juunu 23. N'otu aka ahụ, Maimala Buni abụrụla onye odeakwụkwọ gburugburu nke APC. Enweghị onye ya na ya zọrọ ọkwa a, nke bụ na ọ dị ihe bekee kpọrọ 'unopposed'. Ndị APC mere ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị ebe ha mere ntuliaka iji họpụta ndị ga-achị ha n'ime afọ anọ na-abịa. Nzukọ a mere n'Eagles Square dị n'Abuja, ebe ndị ọrụ nchekwa dị iche iche juru. Onyeisiala Buhari so mee ntuliaka ịhọpụta ndị ga-achi APC Onye ntakụkọ BBC nọ n'ọgbọ ahụ kwuru na ụzọ niile na-abata ogige ahụ kpọchichara akpọchi. O kwukwara na ndị uweojii gwara ya na ha zipuru ihe ruru ndị ọrụ nchekwa puku ise (5000), ụgbọelu helịkọpta abụọ nakwa ụgbọala 'armoured personnel carriers' isii n'ebe ahụ. Ndị isi APC zuru n'ebe emere ntuliaka a Ndị mmadụ si mpaghara ọwụwa-anyanwụ bịa Mana, na mbido, mmiri mere ka ọ ga-emebiri ndị APC ihe ka o bidoro n'ụtụtụ zogide ruo ehihe. Ndị mmadụ nọdụ ala ebe mmiri agaghị ama ha, ma chere ka o zochaa tupu ha amalite ime ihe butere ha n'ọgbọ ahụ. Ndị mmadụ nọ na-eche ka mmiri zochaa
[ "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "All Progressives Congress" ]
https://www.bbc.com/igbo/44588605
Akụkọ kachasị n'abalị a: Ozi ọma! Carl Ikeme agbakewela
Onye oche goolu Naịjirịa agbakewela n'ọrịa. Gụrụ akụkọ niile mere n'abalị a na gburugburu ụwa n'ịchafụ.
2018-06-23T18:14:19Z
Akụkọ kachasị n'abalị a: Ozi ọma! Carl Ikeme agbakewela n'ọrịa
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a Ogbunigwe agbaala na mba Afrịka abụọ Etiopia Ebe ogbunigwe a gbara mgbe ọ mechara n'Itiopịa N'Itiopịa, ogbunigwe emerụọla ihe karịrị mmadụ iri asatọ na atọ ahụ ma gbuo otu onye. Ogbunigwe a gbara n'ebe ndị na-akwado praịm mịnista ha bụ Abiy Ahmed gbakọrọ maka nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị. N'akụkọ yiri ya, onweghị ihe mere Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa, ka ogbunigwe gbapụrụ n'obodo Bulawayo ka o kwuchara okwu ebe a na-eme nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị, mana, osote ya na ndị ọzọ ọkwa ha gbalitere, so na ndị merụrụ ahụ. APC ahọpụtala onyeisi ọhụrụ Ndị APC ebidola ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị ebe ha na-eme ntuliaka iji họpụta ndị ga-achị ha n'ime afọ anọ na-abịa. Adams Oshiomhole bụbu aka na-achị Edo steeti pụtara ka onyeisioche APC na-enweghị onye na-azọsa ya oche. N'egwuregwu, Tunishịa alaala ka ndị Beljịọm nyụrụ ha ịkpakwụ ka ha gbara ha ọkpụ goolu ise a satara abụọ oge ha zutere n'Iko Mbaụwa taa. Ebe Carl Ikeme bụ onye oche goolu Naịjirịa na-arịa ọrịa ọbara kemgbe otu afọ, kwuru na ọ gbakewela ma kelee ndị Naịjirịa na ndị otu Wolverhampton maka nkwado ha nyere ya. Gee nkeji nke abalị a ebe a Ihe nkiri nke taa Otu nwoke na-esi ofe gosiri akaọrụ ya ebe a.
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Iko mba uwa FIFA 2018", "All Progressives Congress", "Iko mba ụwa", "Ethiopia", "Zimbabwe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44569481
Nwụchị Abaribe: Ihe otu na-achọ Biafra kwuru maka ya
Ipob ekwuola na ọ bụ maka nkwado Enyinnaya Abaribe na-enye ha kpatara gọọmentị Naịjirịa ji nwuchie ya.
2018-06-24T07:00:11Z
Nwụchị Abaribe: Ihe otu Ipob kwuru maka nwụchị ya
Eyinnnaya Abaribe Ndị otu IPOB etinyela ọnụ n'ihe gbasara nwụchi omeiwu Enyinnaya Abaribe. Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Emma Powerful kwuru sị na ọ bụ maka ihe gbasara IPOB ka e ji nwụchie ya, maka na gọọmentị etiti na-achọ 'ịgbọchi ndị Igbo ọnụ'. O kwuru sị tọghapụ ya ozugbo ozugbo. Ipob rịọrọ ndị gọọmentị mba ofesi ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka sị ha tinye ọnụ n'okwu a gbasara Abaribe na gọọmentị etiti. Ha kwukwara na onweghị ihe ga-eme ka ha kwụsị ọchịchọ Biafra. Gọọmenti etiti na-atụ asị-Nwunye Kanu 'Nwunye Kanụ na-arọ nrọ' N'aka ọzọ, otu akpọrọ 'World Igbo congress' kpọkuru gọọmenti etiti ka ha tọghapụ Abaribe na-etinyeghị ọnọdụ ọbụla. N'akwụkwọ onyeisi otu ha bụ Anthony Ejiofor binyere aka, ha kwuru na ha hụtara nwụchi a dika ụzọ gọọmenti etiti si ekechi ndị na-akwadoghị ha ọnụ. Ncheta Biafra: Ihe mere n'ọwụwa-anyanwụ Okwu Chimamanda etinyela ọkụ na Soshal midia Cheta na Ohaneze Ndigbo rịọrọ ndị okaikpe Naịjirịa ka ha ghara ime dịka ndị "gọọmentị etiti Naịjiria na-eji aka ike na-emegbu ndị Igbo" na Naịjirịa. Ohaneze Ndigbo n'ime akwụkwọ ozi a gbasara ndị ntakụkọ, kọwara na ha kwuru ihe a maka nwụchị ndị DSS nwụchịrị omeiwu na-anọchị anya Abia saụt bụ Eyinnaya Abaribe. Ha si na ha kwusiri ike n'ihe a mere makana ndị DSS na-achọ onyeisi ndị otu Biafra bụ Nnamdi Kanu bụ onye Abaribe gbaara akaebe. Kwụsịnụ ịta Chidoka na Abaribe amusu maka Nnamdi Kanu - IPOB Kpọpụta Nnamdi Kanu ụbọchị ikpe ya Cheta na ụnyaahụ, Ohaneze kwuru na Abaribe emeghi njọ ịgbara Kanu akaebe, nakwa na ọ bụ ndịagha Naịjirịa bụ ndị kwesiri ịchọpụta Kanu, na ọbụghị Abaribe. Onyeisi ndị otu a bụ Nnia Nwodo, kwuru n'ime akwụkwọ ozi a na ọ dị mkpa ka onye ọbụla cheta na ọ bụ mwakpo ndịagha wakporo ụlọ Kanu n'Umuahia mere ka ọnọdụ Kanu jiri gbagwojuo anya. Nwodo gakwara n'ihu sị na "ọ bụ sọọsọ ndị agha Naịjirịa nwere ị chọpụta ebe Kanu nọ ugbua. Makana ihe mere n'Umuahia ụbọchị ahụ bụ agha" Nwodo kwukwara na ụbọchị a wakporo be Kanu, na o nwere ike ịbụ na ọ nwuru maọbụ na ọ nwụghị. Ohanaeze kwuru na ha na-arịọ ndị okaikpe ka ha kwụsị mmegbu ha na-emegbu ndị Igbo na kwa ka ha gba mgbo hu na a hapụrụ Abaribe kpam kpam. Ndị otu Biafra ahụbeghi onye isi ha Nnamdi Kanu ka mgbe Seputemba 2017 Cheta otu pati na-anọghi na ọchịchị nke a kpọro Peoples Democratic Party (PDP) na Bekee etinyere ọnụ na okwu nwụchị a ndị ngalaba nchekwa a kpọrọ DSS nwụchịrị onye na-anọchịte Abia Saụt na ụlọomeiwu ukwu. Site na ozi ha gbasara, ndị PDP kwuru na etu e siri nwụchie Abaribe dị ka etu e si anwụchi ndị echere na ha kpara mkpamkpa, bụ ihe ha che na ọ na-agba ama etu pati na-achi bụ All Progressives Congress (APC) siri chọọ ime ndị akwụnyeghị n'azụ ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 nke onyeisiala Muhammadu Buhari. Ha gakwara n'ihu kwuo na nwụchịkọ Abaribe bụ ụdịrị agwa Buhari n'ọchịchi ya chọrọ ịkpasị ndị "nọ na ụlọomeiwu ọnụ ha na ada ụda, ọkachasi etu osiri metụta ebe o na ada iwu obodo". Cheta na ndị DSS nwụchịrị Abaribe n'Abuja tata mana a mabeghị ihe ha jiri mee nke a. Cheta na Abaribe bụ onye kwụnyere Nnamdi Kanu dịka onye akaebe ị ji gbapụta ya n'ụlọịkpe Abaribe nọ n'ebe ọ na-akpụ isi n'Abuja mgbe ndị uweojii a pụrụiche nwụchiri ya. BBC Igbo na-agba mbọ ị nweta ụfọdụ ndị ụlọọrụ ndị uweojii pụrụ iche bụ DSS ị mata ihe ha ji nwụchie ya. Abaribe bụ Sinetọ na-anọchị anya Abịa-Saụt n'ụlọomeiwu kwuru n'ọnwa Eprelu na ndị ọchịehi na-achọ ị nara ụmụ Igbo ala ha Lee ihe onyonyo ebe o kwuru nke ahụ ebe a. Akụkọ ga-amasị gị: World Cup 2018: Ugo Naịjirịa efeliela ọzọ Ihe ihere ji kwesị ime ndi omeiwu Igbo: Chekwas Okorie Kedụ nwa afọ Igbo ahụ Buhari mere otu n'ime ndị isi CBN?
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/44608284
Akụkọ kachasị n'abalị a: Ụlọikpe enyela ndị otu Nnamdi Kanu 'bail'
Ndị otu Nnamdi Kanu enwetala 'bail' ebe ụlọikpe kpọrọ Omeiwu Enyinnaya Abaribe. Gụọ akụkọ ndị mere taa n'ịchafụ.
2018-06-25T18:36:22Z
Akụkọ kachasị n'abalị a: Ụlọikpe enyela ndị otu Nnamdi Kanu 'bail'
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a Ndị otu Nnamdi Kanu enwetala 'bail' Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka a hapụ ndị otu Nnamdi Kanu nọ na nga kamgbe afọ atọ n'ọnọdụ bekee kpọrọ 'bail'. Ọkaikpe Binta Nyako kwuru na ọ na-ahapụ ha na bail maka ọnọdụ ahụike ha nakwa afọ ole ha nọrọla na nga. O kwuru na ọ bụrụ na ikpe maa ha, na ha kwesịrị inweta ihe ruru afọ ise maọbụ asaa, mana ha anọrọla afọ atọ. Kwụsịnụ ịta Chidoka na Abaribe amusu maka Nnamdi Kanu - IPOB Ipob asaala Gọvanọ Ikpeazu "Onweghị ihe gosiri na ọ bụ ndị agha ji Kanụ" Cheta na Ọkaikpe Nyako nyere iwu ka a ghara ikpekọta ikpe Kanu na ndị otu ya n'ụbọchị Febụwarị 20, 2018, maka na amaghị ebe Kanu nọ gbochiri ọganihu ikpe ha. Mmadụ anọ a hapụrụ bụ Bright Chimezie, Chidiebere Onwudiwe, Benjamin Madubugwu na David Nwawuisi, bụcha ndị otu Ipob. Nyako kwuru na otu n'ime ha bụ Chimezie nwetaburu 'bail' n'ọnwa Mee nke 2017, mana ndị DSS ji ya oge ahụ jụ ịtọghapụ ya. Ọnọdụ 'bail' o nyere ha bụ ka ha kpọta mmadụ abụọ bụ ndị akaebe ga-enwe nde naịra 10, nakwa ka ha ghara ịgwa ndị ntaakụkọ okwu maọbụ sonye na nzukọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị. Ha ga na-agakwukwa ndị kọmishọna ndị uweojii nọ na steeti ebe ha bi, kwa izu abụọ. Gịnị ga-eme Abaribe echi? Omeiwu Enyinnaya Abaribe a ga-anọ n'ọchị ka ọ bụ akwa echi? Echi bụ ụbọchị ndị ụlọikpe kwuru sị ya kpọpụta Nnamdi Kanu ma ọ bụ ọ takwute ya aja. Cheta na ụlọikpe ukwu nke Binta Nyako nọ n'isi ya nyere iwu n'ikpe o kpere n'ọnwa Maachị afọ 2018 ka onye omeiwu Enyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ndị ọzọ gbaara Nnamdi kanu akaebe, kpọta ya ụlọikpe oge a ga-ekpe ikpe ya ọzọ n'ọnwa Juun ma ọ bụ ha agaa mkpọrọ. Kpọpụta Nnamdi Kanu 'Anyị akpachighị ndị Jew n'ụlọ Nnamdi Kanu' Ipob sị ka ekpebie ikpe Nnamdi Kanu N'akụkọ mba ofesi Ndị ọrụ nchekwa si mba Amerịka bụ FBI erutela Itiopịa ebe ha ga-enye aka ime nyocha ogbunigwe gbapụrụ ma merụọ ndị mmadụ ahụ ụbọchị ole gara aga. N'otu aka ahụ, otu onye na-echekwa onyeisiala ndị Zimbabwe anwụọla site n'ahụ ọ merụrụ ka ogbunigwe gbara ebe onyeisiala Emmerson Mnangagwa na-ekwu okwu ụbọchị abụọ gara aga. N'egwuregwu, Ureguwa ji ọkpụ goolu atọ merie ndị na-ele ọbịa asọmpi Iko Mbaụwa bụ Rọshịa. Ebe ndị Sawudi Arebia ji ọkpụ goolu abụọ merie Ijipt, nke bụ na Ijipt apụọla n'asọmpi a. Gee nkeji nke abalị a ebe a Ihe nkiri nke taa Otu nwoke a kpọrọ Festus Ijeomah na nwanne ya nwoke gara n'ụlọọrụ ndị FRSC nke e ji 'Road Safety' mara, ebe ha gosipụtara iwe ha maka ụgbọala ya ndị FRSC kpọkasịrị kemgbe afọ 2017.
[ "Egwuruegwu", "Bọọlụ", "Iko mba ụwa", "Zimbabwe", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44601113
Gịnị ga-emezi Abaribe ma Kanu abịaghị ikpe ya taa?
Taa ka Ọkaikpe Binta Nyako nyedebere Sinetọ Enyinnaya Abaribe iji kpọta Nnamdi Kanu maọbụ ọ gaa nga.
2018-06-26T04:48:23Z
Ikpe Nnamdi kanu: Abaribe ọ ga-anọ n'ọchị ka ọbụ akwa taa?
Sịnetọ Eyinnaya Abaribe Ụlọikpe ukwu nke Binta Nyako nọ n'isi ya nyere iwu n'ikpe o kpere n'ọnwa Maachị afọ 2018, ka onye omeiwu Enyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ndị ọzọ gbaara Nnamdi kanu akaebe kpọta ya ụlọikpe oge a ga-ekpe ikpe ya ọzọ n'ọnwa Juun ma ọ bụ ha agaa mkpọrọ. Mana Ọkaikpe Nyako nọkwa n'ụlọikpe n'Abuja ụnyaahụ kwụgharịkwa na ha agwala ndị niile gbaara Nnamdi Kanu akaebe ka ha niile bịa ụlọikpe taa maọbụ kwuo ihe mere ha agaghị eji gaa nga ma hapụ ego ha jiri gbaa akaebe. Nwụchị Abaribe: Ihe otu na-achọ Biafra kwuru maka ya Kwụsịnụ ịta Chidoka na Abaribe amusu maka Nnamdi Kanu - IPOB Nwụchị Abaribe: Ihe otu na-achọ Biafra kwuru maka ya Ndị gbara aka ebe ahụ bụ Sinetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye na-anọchite anya ndịda Abịa n'ụlọ omeiwu sineti, onye ụkọchukwu ndị Juu bụ Immanuel El-shalom na otu onye ọzọ bi n'Abuja bụ Tochukwu Uchendu. Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe maka imegide ọchịchị ala Naijiria, bụ onye a na-achọ achọ kemgbe ọnwa Sepụtemba afọ 2017 ka ndị agha Naijiria wakpochara ụlọ ya oge ha gbara Egwu Eke na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa. Nyako ga-ekpe ikpe ahụ taa n'Abuja ebe a ga-anọ mara ihe ga-eme Abaribe na ndị ọzọ so ya gbaa akaebe ahụ. Cheta na Abaribe na ndị ọzọ ahụ gbara akaebe ahụ ụbọchị 28 ọnwa Epurel afọ 2017, ma kwe nkwa ịkpọta Kanu n'ụlọikpe maka ikpe ya dịka ha debere ego ruru otu narị nde naịra. Ndị ọrụ nchekwa DSS nwụchiri Abaribe kamgbe ngwụcha izuụka mana ha ekwughi ihe o mere ha jiri nwụchie ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị Mgbanwe ego: Dọla ọdaala n'akụkụ Naịra? Enwe achụpụla ndị mmadụ na Legọs Atiku etinyela ụkwụ na ndọrọndọrọ 2019
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-44626330
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị nche awakpoola Ezekwesili
Ndị nchekwa dị icheiche awakpoola Ezekwesili ebe DSS tọhapụrụ Eyinnaya Abaribe na akụkọ ndị ọzọ.
2018-06-27T08:40:11Z
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị nche awakpoola Ezekwesili
Ezekwesili na-ebe akwa na ha nwakporo ya Onye bụbụ minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Oby Ezekwesili ekwuola na ndị uweojii, ndị agha na ndị DSS wakporo ya ụnyaahụ oge ọ na-eme ngagharị iwe gbasara ogbugbu ndị mmadụ mere na Platu steeti. Ezekwesili dere n'elu twitter ya na ha wakporo ya n'ihu ụlọ obibi onyeisiala nara ya ọkọlọtọ ya. Ha atọhapụọla Eyinnaya Abaribe Ndị DSS atọhapụọla Abaribe bụ onye ha ji kemgbe abali Juun 15 gara aga n'okpuru ihe ndị Bekee kpọrọ Administrative bail. Onye mgbasaozi ya bụ Uche Awọm gwara BBC Igbo na Abaribe ga-alaghachị ọrụ taa. Ndị ọchịehi ji egbe egbuola ndị agha abụọ n'obodo Goma n'ime Benue steeti Akụkọ kwuru na ha wakporo ha oge ha na-achọ onye gwuru nnukwu olulu n'ọkpọrọ ụzọ n'ime obodo ahụ. Grace Mugabe chọrọ igbu m - Mnangagwa N'Afrika, Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa kwuru na ya na-eche na nwuye onye chiburu ala ha bụ Grace Mugabe chọrọ igbu ya. Mnangagwa na-ebo otu nwunye Mugabe na ha tụrụ ogbunigwe gburu mmadụ abuọ ma meruo mmadụ iri anọ ndị ọzo ahụ. Obi agbawaala ndị Naịjirịa N'egwuregwu Umu Naijiria na-ebe akwa na social media na ha gbapuola Naịjirịa n'asọmpi Iko mabụwa. Mana onye nkuzi ha bụ Gernot Rohr na-enwe olile anya na ha ga-eme karịa n'afọ 2022 na Kata. Gee nkeji anyị n'ụtụtụ a Ihe onyonyo nke taa
[ "Naijiria", "Ngosi iwe", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ọgụ ndị na-achịehi", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Ngosi", "Zimbabwe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44632971
Plateau: Nkwekọrịta Buhari, Saraki na Dogara nwere
Onyeisiala Buhari na ndị isi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogara zutere taa ebe onyeisiala kwuru na ọ ga-ekpogharị nchekwa Naịjirịa.
2018-06-27T15:16:53Z
Plateau: Nkwekọrịta Buhari, Saraki na Dogara nwere
Buhari, Saraki na Dogara Mkparịta ụka ha na-abịa n'ime abalị anọ awakpochara ụfọdụ dị mmadụ ma gbuo ihe ruru mmadụ iri asatọ na isii na Plateau Steeti Onyeisiala Buhari na ndị isi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogara nwere mkparịta ụka taa. Onyeisiala kọwara ndị isi ụlọomeiwu ihe ndị ọ na-eme i ji gboo nsogbu nchekwa dị na Naịjirịa ugbua. Plateau: 'Ha gburu nne m, nna m, nwunye m na ụmụ m' Plateau: 'Ozi ịtiakanobi ezughi' Na ngwụcha nzụkọ ha, onyeisi ụlọomeiwu ntaa bụ Yakubu Dogara gwara ndị ntaakụkọ na okwu nchekwa abụghị okwu a na-ekwuputa n'ihu ọha. Ọ gara n'ihu kwuo na onyeisiala gwara ha na ọ ga-ekpogharị nchekwa ala Naịjirịa. Onyeisiala Buhari na ndị isi ụlọimeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogaran na-enwe mkparịta ụka O kwuru na agbanyeghi na ugbu a bụ oge iri uju, na ndị Naịjirịa agaghị a na-abata ọnọdụ enweghị nchekwa. Dọgara n'aha ndị ụlọomeiwu zigara ezinaụlọ ndị ihe a metụtara ozi iti aka n'obi. Onyeisiala Mohammadu Buhari kwupụtara nzụkọ ahụ site n'akara twitter ya. Mkparịta ụka ha na-abịa n'ime abalị anọ awakpochara ụfọdụ ndị mmadụ ma gbuo ihe ruru iri asatọ na isii na Plateau steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ebonyi: Esemokwu Izzi na Ukelle atala isi mmadụ 500 Plateau: Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eru uju apụtala n'iwe DSS ahapụla Abaribe, ọ ga-alaghachị ọrụ taa
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ọgụ ndị na-achịehi", "Jos" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44632972
Akụkọ kachasị n'abalị a: Grace Mugabe chọrọ igbu m - Mnangagwa
Onyeisiala mba Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwe ekwuola na Grace Mugabe chọrọ igbu ya na akụkọ ndị ọzọ.
2018-06-27T18:17:23Z
Akụkọ kachasị n'abalị a: Grace Mugabe chọrọ igbu m - Mnangagwa
Akụkọ dị mkpa; Emmerson Mnangagwe ekwuola na Grace Mugabe chọrọ igbu ya. Onyeisiala mba Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa ekwuola na ọ bụ ndị otu nwunye onyeisi mba n'oge gara aga bụ Grace Mugabe chọrọ ị ji ogbunigwe gbagbuo ya. Cheta na mmadụ abụọ nwụrụ, ebe mmadụ iri anọ nwere mmerụ ahụ n'ogbunigwe gbara oge ọgbakọ ndọrọ ndọrọ n'ala ahụ. Anwụchiela onyeisi mahadum Zimbabwe Ndị zuru ego Zimbabwe eweghachila ya Buhari, Saraki na Dogara emeela mkpebi maka nsogbu dị na Platu Steeti: N'ihi ogbugbu ọtụtụ ndị mmadụ na Platu Steeti, onyeisiala bụ Mohammadu Buhari na ndị isi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogara nwere mkparịta ụka ime ụlọ taa. Na mkparịta ụka ahụ, Buhari gwara ha na o bu n'obi ikpogharị ọrụ nchekwa na Naịjirịa. Plateau: 'Ha gburu nne m, nna m, nwunye m na ụmụ m' Plateau: Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eru uju apụtala n'iwe Ọgbaghara atala isi mmadụ ruru narị atọ n'Ebonyi/Krọss River Steeti: Ndị mmadụ bu akpa ha agbapụ ọzọ agbaga obodo ndị ọzọ Ndị obodo Igbeagụ dị n'Ebonyi Steeti agbala ọsọ ndụ na-eleghi anya n'azụ maka nsogbu dị n'etiti ha na ndị Ukelle nke Kross Riva Steeti n'ịzọ oke ala. BBC Igbo chọpụtara na esemokwu ahụ bụ nke malitere kamgbe afọ 2015 atala isi mmadụ ruru narị atọ. N'egwurewgu: Mba Jamịnị bụ ndị ji bu Iko Mbaụwa agwakọrọla laa na nke afọ a dịka Saụt Korịa gbara ha ọkpụ abụọ asataghị otu N'aka nke ọzọ sweden gbara Mexico ọkpụ atọ mana mba abụọ ndị etozuola oke n'agba abụọ nke asọmpị a. Nkeji Nke abalị a: Ihe nkiri nke taa:
[ "Germany", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Iko mba uwa FIFA 2018", "Ọgụ ndị na-achịehi", "Ebonyi Steeti", "Bọọlụ", "Kross Riva Steeti", "Iko mba ụwa", "Zimbabwe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44663700
'Awụbara m n'ọwa mmiri iji gbanarị ọkụ 'tanka' ahụ'
Otu nwoke bụ onye ọkwa ụgbọala aha ya bụ Wasiu Olaitan kọwara BBC etu o si gbanarị ọkụ ọgbagba tanka mmanụ agbidi gburu ndị mmadụ na Legọs.
2018-06-29T19:47:28Z
Ọkwọ-ụgbọala: Awụbara m n'ọwa mmiri iji gbanarị ọkụ ahụ
N'okwu ya, Olaitan kwuru na ọ wụbara n'ime ọwa mmiri (gụtter) i ji gbanarị ọkụ ahụ. O kwuru na o bu ọtụtụ ndị mmadụ n'ụgbọala mgbe mke mere mana Chineke zọrọ ha ndụ.
[ "Naijiria", "Njem" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44525978
Ihe 7 ị ga-eji cheta ndị Naịjirịa ma ị zute ha n'ụgbọelu
Ọtụtụ ndị Naịjirịa emeela ihe ndị a ga-eji cheta ha na njem ọkachasị njem ndị a na-aga mba ofesi.
2018-07-01T14:18:18Z
Ihe 7 ị ga-eji cheta ndị Naịjirịa ma ị zute ha n'ụgbọelu
ụgbọelu Ị nwere ahụmihe pụrụ iche sitere n'oge gị na ndị Naịjirịa ndị ọzọ banyere n'otu ụgbọelu? Ị ma na ụfọdụ ndị na-echefu na ha nọ n'ihu ọha ma ha na-akpa ụdịrị agwa nwere ka ọ dị ma ha nọrọ n'ụgbọelu? Nke a butere akụkọ a BBC Igbo dere iji gosipụta akparamagwa ndị a. Ndị mmadụ tụmadụ ndị Naịjirịa na-eme ihe ndị e ji enyo ha enyo ma ụkwụ ha banye n'ụgbọelu. Ị ma ebe njirimara ala Igbo ụfọdụ dị? Afọ ole ka ị ga-ebi n'ụwa? Ihe ise ị maghị maka 'Yahoo-Yahoo' 1) Ịkụ aka: Kedụ etu ọzọ ị ga-esi mara na ị rutela n'ọdọ ụgbọelu Naịjirịa ma ọ bụrụ na ị nụghị ka ndị mmadụ na-akụ aka? Ọtụtụ oge, ndị mmadụ na-akụ aka ma ụgbọelu tụọ ụkwụ n'ọdụ ụgbọelu dị na Naịjirịa. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ n'ihi aṅụrị na ha anwụghị n'ihe mberede ụgbọelu mere ha ji akụ aka. Mana gịnị kpatara ha anaghị eme etu a ma ụgbọelu fetuo na mba ndị ọzọ na-abụghị Naịjirịa? Ị bụrụ onye si mba ọzọ bata ma ị maghị na ndị Naịjirịa na-emekarị ụdịrị ihe a, ọ ga-abụ ihe ọhụrụ na ihe ịtụnanya nye gị. 2) Ikpe ekpere/iti mkpụ ọṅụ: Ihe ọzọ ga-egosi na gị na ndị Naịjirịa nọ n'otu ụgbọelu bụ 'ekpere'. Ndị Naịjirịa ma etu esi ekpe ekpere nke ukwuu. Ụfọdụ na-ekpe ya maka na ọ bụ ihe marago ha ahụ, ebe ndị ọzọ na-ekpe ya site n'ụjọ mberede na-esi n'ife n'elu. Ihe ọzọ ha na-eme bụ iti mkpụ ọṅụ ma ụgbọelu fetuo nakwa ime 'n'afa nna' iji gosi obi ọma ha na ha anwụghị n'ihe mberede. Ị ga-ata ha ụta ebe ihe mberede ụgbọelu emeela ihe karịrị ugboro iri na Naịjirịa? 3) Ịkọ akụkọ Ihe ọzọ e ji mara ndị Naịjirịa n'ụgbọala bụ ịkọ akụkọ ka ha niile esi n'ime otu ọnụụlọ pụta. Ma ọ bụ ụjọ ka ọ bụ obi ọma na-ebute akparamagwa a, enweghị onye nwere ike ịkọwanwu ihe mere ndị Naịjirịa na-eji eme omume a. Agwa a nwere ike ịgbakasị ndị ọzọ ha na ndị Naịjirịa na-eme njem ụgbọelu ahụ, mana ebe o si ka njọ bụ na ndị na-eme ya anaghị ahụta ya ka ihe ọjọọ. 4) Ịba mba/ịkọ ọnụ Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-esete ihe nkiri ebe ndị Naịjirịa na-akọ ọnụ n'ime ụgbọelu. Oge ụfọdụ, ihe na-ese abụghị ihe ọzọ karịa na a na-azọ oche maọbụ na a na-azọ ebe a na-etinye akpa n'ime ihe a kpọrọ 'overhead bin'. Maka etu ụgbọelu dị, ọ bụghị oge niile ka ị ga-etinyenwu akpa n'ime 'overhead bin' dị n'ebe oche gị dị. Nke a kpatara ụfọdụ ndị mmadụ na-eji akọ ọnụ ma onye ọzọ si n'oche ọzọ bịa itinye ihe n'oche ha. Ihe ndị ọzọ nwere ike ibute esemokwu n'ime ụgbọelu bụ ebe a gara mposi maọbụ ebe ndị mmadụ na-azọ onye ga-anọ n'isi mpio. 5) Ise foto Ọ na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ ise foto a kpọrọ 'selfie' ma ha banye n'ụgbọelu. Nke a abụghị naanị ndị Naịjirịa ka ọ metụtara, mana ụfọdụ na-akawa ahụ gaa n'oche na-abụghị nke ha maka ise foto a. Ọ bụghịzị ihe ọhụrụ ịhụ ka onye kwesịrị ịnọ na 'economy class' biliri ọtọ gaa n'oche ndị 'business class' ise foto ma ụgbọelu tụọ ụkwụ n'ala. Ha na-eme ya ma ụgbọala fetuo, maka na ndị nọ na 'business class' na-ebu ndị 'economy class' ụzọ aritu. Ego ha na-akwụkwa na-aka nke ndị 'economy class', nke kpatara ụfọdụ ji ese foto a igosi 'ị makwa ndị anyị bụ'. N'otu aka ahụ, ụfọdụ na-ese foto n'ime ụgbọelu iji gosi ndị mmadụ na ha 'so nn'ihe a na-eme', ọkachasị ndị ọ bụ mbụ ha na-efe n'ụgbọelu. 6) Ịrịọ efere nri ọzọ Nke a bụ ọnọdụ ebe mmadụ ga-asị ndị ọrụ ha bụ ịlekọta ndị na-eme njem ụgbọelu ka o nye ya efere nri maọbụ iko mmanya ọzọ. Bekee kpọrọ ya 'second helping'. Ọ bụghị na ọ bụ naanị ndị Naịjirịa na-eme etu a, maọbụ na ọ bụ ihe ọjọọ ime ya, mana ị banye ụgbọelu bu ndị Naịjirịa, ị ga-ahụ ka ọtụtụ mmadụ na-ana ihe oriri ugboro ugboro. N'afọ 2017, otu onye na-arụ na British Airways were iwe ma kwuo etu o si kpọ ịrụ ọrụ n'ụgbọelu bu ndị Naịjirịa asị. 7) Ibili ọtọ tupu ụgbọelu akwụsị Gịnị mere o ji adị ndị Naịjirịa ọsịsọ iritu n'ụgbọelu? Ọtụtụ ndị mmadụ anaghị ekwe ka agbapee ụzọ ụgbọelu tupu ha ebilite ọtọ gawa nso ụzọ ahụ. Ị banye n'ụgbọelu ndị Naịjirịa nọ n'ime ya, ị ga-ahụ na ozugbo ụkwụ ụgbọelu ahụ tụrụ n'ala, ọ dị ha ọsịsọ iritu. Ọ bụ obiọma na ihe mberede emeghị ka ha ji eme omume a? Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị njem ụgbọelu atọla taa Ụgbọelu Osinbajo enweela nsogbu n'elu Ihe dị n'akpa gị e nwere ike ịkpọga gị nga?
[ "Omume", "Naijiria", "Njem ụgbọelu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44693655
Ụmụnna na otu anọ ọzọ kacha mkpa n'ala Igbo
Ndị Igbo nwere etu ha si achị onwe ha oge mbụ tupu ndị ọcha abịa e bido ichi igwe na eze na echichi ndị ọzọ dị icheiche.
2018-07-03T14:03:53Z
Ụmụnna na otu anọ ọzọ kacha mkpa n'ala Igbo
Ndị eze 'Igbo enwe eze' bụ otu okwu ma nwa a mụrụ n'ala Igbo taa mara maka na ndị igbo na-ahụta onwe ha dịka ndị enweghi otu onye a kpọrọ eze. Mana nke a apụtaghị na igbo enweghị usoro ọchịchị na-agara ha nke ọma na mgbe ochie. Usoro ahụ nwere ike ọbụghị usoro ndị ọzọ nabatara mana ọ bụ etu ha ghọtara iji chịa onwe ha na-enweghi nsogbu ọbụla. Ihe ise masịrị ụmụnwaanyị Ụmụnwaanyị ewechighala isiowu n'ụdị ọhụrụ I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo? Mana oge ndị ọcha bịara, usoro a edoghi ha anya. Usoro a bụ otu dị iche iche nwere ọrụ ha na-arụ n'obodo ịhụ na enweghi nsogbu dapụtara nakwa enweghi arụ ọbụla ga-emerụ ala. Otu ndị a bụ; Ọkpala, Ụmụnna na ụmụada, otu ọgbọ, ndị nze na ọzọ na mmanwụ. 'Ndị ụlọ anyị sị m ma alọtazina ụlọ ọzọ ma m ahụghị di' Osu a ga-akwụsị n'ala Igbo? Lee uwe ndị Igbo na-eyi aga igba nkwu Ihe otu ndị igbo na-arụ 1. Ndị nze na ọzọ - Ndị nze na ọzọ bụ dị kachasị n'obodo, ha bụ ndị ikpeazụ okwu na-agakwu. Ha bụ ekwucha ọgwụ n'okwu niile gbasara obodo. Ha bụ ndị na-eji omenaala na ọfọ obodo ịhụ na a na-ekpe ikpe ziri ezi nakwa ịhụ na aka mmadụ niile kwụ ọtọ. Tupu anabata mmadụ n'otu a, ọ ga-abụ onye amamihe ha na-akpụ n'ala site n'ihe ọ hụrụla na ihe ọ gabigarala Ya mere o ji abụ ụmụnwoke garala ọgụ na agha na mgbe mbụ, merie n'agha ma oge ụfọdụ jiri okpokoro isi mmadụ lọta. A na-akwanyere ha ugwu pụrụiche n'ala Igbo ebe ndị nọ n'otu nze na ọzọ na-eyi ugo n'okpu ha igosi na ha bụ ndị e ji eme ọnụ n'obodo maka na ugo bụ nnụnnụ kachasị mma n'ala Igbo. Akwa ọcha ha na-eyi na-egosi ndị dị ọcha n'obi nakwa n'agwa nakwa n;ikpe ziri ezi. Okpu mmemme ha na-ekpu na-egosi na site n'ahụhụ ha nakwa ọbara ha mefuru n'agha ka ndị obodo ha ji aga n'ihu. E kere ya udo abụọ; ndị nze na ndị ọzọ. Ndị nze karịrị ndị ọzọ n'ọkwa. 2. Ụmụnna - Ndị a bụ ụmụnwoke ụmụọkpala si n'ezinaụlọ dị icheiche n'obodo. Ha bụ ndị na-eme mkpebi gbasara okwu dị icheiche n'obodo etu o si gbasara agamnihu na ọdịmma obodo. Ndị ụmụnna ka a na-ekpesara ma onye ọbụla mee ihe ọjọọ, ha bụ ndị na-aga n'ọnụ arụsị ịchọpụta ihe arụsị na-ekwu gbasara obodo maọbụ gbasara ezinaụlọ ha. Ezinaụlọ niile na-enwe ndị ụmụnna ha bụ ebe a na-ebido ikpe ọbụla gbasara esemokwu dịka okwu ala, okwu ime obi, okwu gbasara ihe nketa nwaanyị na arụ megidere ala dịka onye gburu mmadụ, izu ohi, ịkwa iko maọbụ idina nwunye maọbụ di mmadụ. Mkpebi ọbụla ha mere na-adịgịde n'obodo niile. A na-ahụ ụmụnna dịka ndị nnọchite anya si ezinaụlọ dị icheiche. 3. Ụmụada - Otu nke a bụ otu ụmụnwaanyị n'obodo, ebe a ka ụmụnwaanyị na-ejiko onwe ha ọnụ kpaa maka ọdịnaihu ezinaụlọ ha na ihe gbasara di ha na ụmụaka ha. Ndị ụmụada ka a na-akpọ ikpe udo oge ọbụla e nwere esemokwu n'etiti obodo na obodo ma ihe niile ha kpebiri, anaghị agbagha ya agbagha. Ndị ụmụada bụkwa ndị na-ekpe udo n'etiti ụmụnne ha ụmụnwoke na ndị nwunye ha iji hụ na e nwere otu ihu maọbụ otu obi n'ezinaụlọ. Ndị ụmụada gụnyere ụmụnwaanyị ndị a mụrụ n'ezinaụlọ nakwa ụmụnwaanyị ndị alụbatara n'ezinaụlọ. 4. Otu ọgbọ - Nke a bụ otu ebe ndị bụ ọgbọ dịka ụmụnwoke a mụrụ n'otu oge. ha bụ ndị na-ahụ maka nchekwa obodo niile. Ha bụkwa ndị na-aga agha maọbụ ọgụ oge ọbụla ọgụ dapụtara. Ha bụ ndị na-ekpocha ụzọ, mmiri na ahịa ma o nwee ihe gbochiri ya maọbụ na mmiri buru ahịhịa nọchie ụzọ. Ọ bụkwa ha na-emepụta ihe ọbụla otu ụmụnna maọbụ ndị nze na ọzọ nyere n'iwu dịka ọ bụrụ na o nwere onye a ga-achụpụ n'obodo maọbụ onye a ga-amachị. Ha ga-agba mbọ hụ na onye ahụ pụrụ n'obodo ma gatee aka. 5. Mmanwụ - otu mmanwụ bụ otu na-anabata naanị ndị gabigara otu nnabata ha. Ha na-arụ ọrụ ndị uweojii hụ na e nwere usoro n'obodo. Oge ọbụla e nwere esemokwu dịka ala, mmanwụ na-aga kụọ ọmụ n'ala ahụ nke gosiri na o nweghi onye ọbụla a ga-ekwe ka ọ banye n'ala ahụ rue oge a mere mkpebi gbasara ya. Mmanwụ nwekwara oge ọ na-apụta iji mee ndị obodo obi aṅụrị site na ịụ̀ba egwu. Nyiri dị n'ọchịchị oge ahụ na nke ugbua Ndị nze na ọzọ dịka ndị na-achị obodo, ha bụ ndị ikpeazụ okwu ga-erute ntị, ọ bụ okwu ọbụla na-ekweghi mmeta n'etiti ndị ụmụnna na ụmụada ka a na-ewetara ha. Ha bụ ekwucha ọgwụ n'okwu ọbụla Ndị ụmụnna na ndị ụmụada dịka ndị nnọchite anya n'obodo. Ndị ụmụnna na-eme iwu gbasara obodo ebe ụmụ ọkpara n'ezinaụlọ dị icheiche n'obodo na-anọ na ya Otu ọgbọ dịka ndị agha obodo, na-echekwa obodo ma na-ahụ na obodo niile bi n'udo. H na-aga agha maọbụ hazie ihe dị n'obodo na-adịghị eti o si kwesi. Mmanwụ bụ uwejii obodo na-eje akpụpụta ndị mere ajọ ihe n'obodo. Otu ndị a ka ala Igbo ji aga n'oge mbụ tupu ndị ọcha eweta usoro ha kpọrọ 'Warrant Chiefs' ebido. Otu ndị a rụrụ ọrụ n'oge mbụ mee ka ala igbo na-aga n'ihu na-enweghi onye ọbụla ha kpọrọ eze mana etu ọ dị ugbua, a na-echizi eze e ji eme ndọrọndọrọ ọchịchị. Ajụjụ a na-azjụzị bụ, usoro ndị Igbo ji aga ugbua ọ na-eme ha nke ọma karịa usoro ha ji aga oge gara aga?
[ "Naijiria", "Omenala" ]
https://www.bbc.com/igbo/44727338
Gịnị ka ị kwesiri ima tupu ị nabata onye odibo
Akụkọ kọwara ajụjụ niile ị kwesiri igba tupu ịmee onye ọbụla onye nyemaaka.
2018-07-05T20:06:59Z
Gịnị ka ị kwesiri ima tupu ị nabata onye odibo
Onye nyemaaka na-arụ ọrụ dị iche iche n'ime ụlọ Onye bụ onye ahụ ị chọrọ ka ọ bụrụ onye enyemaaka n'ulọ gị? Akụkọ dị iche iche na-apụta n'oge gara aga gosi etu ndị nyemaaka na-atọ ụmụaka maọbụ ya na ha a na-eme mmekọrịta ahụ. N'ọnwa Disemba n'afọ 2014, otu nwaanyị aha bụ Juliet bụbu onye enyemaaka tọrọ ụmụnwata abụọ n'otu ezinaulọ biri na Magodo na Legos steeti. Ị ma ọrụ ndị ụmụnna na otu anọ ọzọ kachasị mkpa n'ala Igbo? Ihe 7 ị ga-eji cheta ndị Naịjirịa ma ị zute ha n'ụgbọelu Nne ụmụaka aha ya bụ Onajite Esharegharan gwara ndị uweojii na ya nụrụ maka onye nyemaaka n'elu webusait a kpọrọ OLX. O nwekwara ụmụaka abụọ ndị odibo tọrọ na Shagamu, ọzọ bụkwa ụmụaka atọ a tọrọ na Shasha na Legos. Mary Akinloye bụ onye nyemaaka ha tọrọ oge ahụ kpọrọ nne na nna ụmụaka n'elu ekwe ntị na-ajụkwa ha maka ego ntọhapụ ruru nde naira 15. Ọtụtụ ezinaụlọ na-emegbu ndị nyemaaka ha O bụ oge okwu pụtara ka ndị uweojii dọrọ ndị nne na nna aka na ntị na ọ dị ezigbo mkpa ka ha maa maka onye ga-abụ nyemaaka na bee onye ọbụla. Mana maka ụwa sị dị ugbua, ọtụtụ ezinaụlọ na-achọ onye ga-abụ onye nyemaaka n'ezinaụlọ ha. Ihe niile diri mkpa ma ị na-achọ onye nymemaaka BBC Igbo gbara otu nwaanyi aha ya bụ Joke Afolabi bụ onyeisi ụlọọrụ na-ezipu ndị ọrụ nyemaaka a kpọrọ 'Conciege and Home Care Services' ajụjụọnụ gbasara okwu a. Afolabi kwuru na ọ bụ eziokwu na ụlọọrụ ha na-ezipu ndị mmadụ dịka ndị nyemaaka gawa ụlọ dị iche iche mana ha na-agba mbọ hụ na ndị niile a tinyere n'ọrụ bụ marị ihe a chọrọ n'ụwa. Onye ọzọ aha ya bụ aha bụ Christanah Akindolie bụ onye ọrụ ndụmọọdụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ dị ezigbo mkpa ka ị bụrụ onye na-edo anya, onye nwere ọchịchọ ịmata ihe niile. Ajuju asaa ịkwesiri ịgba onye ọbụla chọrọ ịbụ onye nyemaaka gị Gba mbọ hụ ọbụghị nwatakịrị bụ onye nyemaka gị 1. Gịnị mere i ji hapụ ebe ị na-arụ n'oge mbu? Ọ na-eme nkọwa a, lee anya ka ị mara n'okwu ya ọ na-adaba. 2. Ebe ka i si bịa? Onye bụ nne na nna gị? Ezinaụlọ gị? 3. Nata ya aha na akara ekwenti onye ọ rụrụ ọrụ n'aka ya tupu ọ bịa na nke gị. 4. Lee uda olu ya nakwa omume ya mgbe ọ na-asa gị okwu. 5. Nye ndị uweojii aha ya, ka ha nyocha ọfụma mara ma ọ bụ onye nupuru isi n'iwu, maọbụ onye ha na-achọ achọ. 6. Kpọrọ ya gaa ụlọọgwụ ka ha nyocha ya, ka ha mara ma ọ dị ime, maọbụ o nwere ọrịa mmịnwụ(HIV), ịba ojii (hepatitis) nakwa ụkwaranta (tuberculosis.) Ha nyochakwa ụdi ọbara dị ya na-ahụ(blood group) maka adịghị a ma ama. 7. Lebanye anya na ndị kwudoru ya dịka onye akaebe. Akụkọ ga-amasị gị Akụkọ na-eme ugbu a: Ụlọikpe akagbuola ntuliaka imeụlọ APC mere n'Imo steeti. Ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa etinyela ọnụ n'ọnwụ 'Corper'
[ "Naijiria", "Ịwakpo mmadu na-ike", "Omenala" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44736373
Biafra: Ndị Naịjirịa ejibeghi ihe mere n'agha Biafra mụta ihe - Okey Ndibe
Okammụta n'odee akwụkwọ a ma ama bụ Okey Ndibe kwuru etu o siri bie ndụ mgbe agha bidoro.
2018-07-06T09:10:08Z
Biafra: Okey Ndibe kọrọ ihe ọ hụrụ dịka nwata nọ mgbe a lụrụ agha Biafra
Okey Ndibe sị na, "Agha abụghị ihe onye ọbụla hụrụ ihe mere n'afọ 1967 ruo 1970 ga-asị ka o mee ọzọ." O kwukwara ihe mere ogbaghara jiri ka dị n'ala Naịjirịa ruo taa. O nyere ndị ntorobịa ọdụmọdụ gbasara otu ha siri chọọ ka ha nwe nwereonwe nke ha - nsogbu ga-adị na ya na ihe ha kwesiri ime. Ndị mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim na Grace Ekpu.
[ "Naijiria", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44755780
E tinyela udo Naịjirịa n'aka Ekweremadu ọzọ
Ọ bụghi mbụ a na-etinye ihe gbasara udo Naịjirịa n'aka osote onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu.
2018-07-08T11:20:07Z
Ndị Igbo kwenyere n'ụkpụrụ 'nye anyị nke ruru anyị' - Onye ndụmọdụ Ekweremadu
Ike Ekweremadu Ekweremadu anọọla ụlọomeiwu Naịjirịa afọ 11, nke mere ka ọ bụrụ onye omeiwu kachasị nọrọ ogologo oge n'ụlọ ọrụ ahụ Nke a bụ mbụ a na-ehibe ọgbakọ 'International Parliament for tolerance and peace (IPTP)' iji wee kwado mmekọrịta na mkparitaụka gbasara ọdimma nakwa nsogbu na-esogbu akụkụ mbaụwa dị iche iche. Ọgbakọ a nke e mere n'izu ụka mbụ n'ọnwa Julaị n'obodo Malta họpụtara Taullant Balla nke si ụlọomeiwu Albania dịka onyeisi mbu, ebe osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa bụ Ike Ekweremadu bụ onyeisi kọmiti na-ahụ maka imepụta iwu na ya. Onyeisi ọgbakọ ukwu a mutara ọgbakọ nke nta (IPTP) a bụ Ahmed bin Mohammed Al-Jarwan, kwuru na dịka mbaụwa niile na-agabiga mkpasuiwe, esemokwu dị n'okpukpere, iyi egwu, ịhọ otu, oke ogbubgu nakwa ndị ọzọ, ọgbakọ a ga-enye aka iweta udo. Akpugo dịzị oyi ugbua - Ebere Amarizu Nọt Koria ka chọrọ nzukọ ha na Trump Trump na Kim a ga-ekwe n'aka nke udo? Al-jarwan kwuru na ọ bụghịzị sọsọ na mpaghara ndị omeiwu na-anochite ka ha ga na-anwa oke ha, na ha kwesiri ịgbasapụ aka udo nye mbaụwa niile. Ihe ọkwa Ekweremadu pụtaara Obodo Naịjirịa Onye ndụmọdụ n'ụlọọrụ Ike Ekweremadu bụ Uche Anichukwu gwara BBC Igbo na ọnọdụ ọhụrụ a bụ nnukwu ihe meere ndị Naịjiria nakwa ndị Igbo. O kwuru na e ji iweta udo mara Ekweremadu mgbe ọ chịburu n'ụlọomeiwu nke 'Economic Community of West African States (Ecowas)'. Anichukwu kwuru na Ekweremadu na ndị omeiwu ndị ọzọ si n'akụkụ mbaụwa niile n'ọgbakọ a ga na-atụgharị uche ma mepụta iwu dị iche iche ga-enyeaka iwebata udo na mbaụwa. Gere ihe o kwuru n'uju ebe a: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Dino Melaye: Onye omeiwu ukwu etiela egwu ọzọ Otu nwoke agbaala onwe ya ọkụ na ndụ A chụọla onye Ndị uweojii gbagburu 'corper' n'ọrụ
[ "Naijiria", "Ikpe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44776458
US: Kwụsịnụ igbu ndị mmadụ na Naịjirịa
Gọọmentị mba Amerịka agwala ogbo ya nke Naịjirịa ka ha kwụsị ogbugbu ndị mmadụ ma nwụchie ndị aka ha dị na ya.
2018-07-10T06:15:54Z
US: Kwụsịnụ igbu ndị mmadụ na Naịjirịa
Gọvanọ Lalong na david Young Osote onyeisi ozi ụlọ nnọchite anya mba Amerịka na Naịjirịa bụ David Young kwara gọọmentị etiti ka ha kwụsị ogbugbu ndị mmadụ ma nwụchie ndị aka ha dị na ya. Young kwuru na ndụ bụ ihe dị nsọ agbanyeghi ogogo, agbụrụ maọbụ okpukperechi onye ahụ. O kwuru nke a mgbe o mere njem iti aka n'obi n'isi ọchịchị Platu steeti bụ Jọs ebe ọ hụrụ Gọvanọ Simon Lalong nke steeti ahụ ụnyaahụ. Lee ihe ndị Buhari na Trump kpara Plateau: 'Ha gburu nne m, nna m, nwunye m na ụmụ m' Plateau: 'Ozi ịtiakanobi ezughi' Young na ndị otu kasiri ndị Platu Steeti obi maka ogbugbu ndị obodo ha mere na nso nso a. Ọ rụtụrụ aka ka ndị mmadụ na-ekwupụta udo na ị dị n'otu mgbe niile. N'okwu ya " Ndụ dị nsọ, agbanyeghi ebe mmadụ ọbụla si pụta, ma ịbụ ọchị ehi, onye ọrụ ugbo, ndị ụka kraịst ma ọ bụ nke alakụba. "Tigbuo zọgbuo bụ okwu dịrị gọọmentị steeti ma ọ bụ nke etiti, ekwesiri ịgba mbọ gbochie ya." Na nzaghachị Gọvanọ Platu steeti bụ Simon Lalong gwara ya na gọọmentị na-agba mbọ igbo nsogbu a. O gwara ya na gọọmentị etiti na mba ụwa niile ga-ekpe ndị anwụchiri ikpe ma taa ha ahụhụ ruru ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe otu CUPP na-eme iji 'chutu' Buhari Ndị ọrụ FRCN gbanyụrụ redio n'ụbọchị 9 Julaị Ọ bụghị iwu na Gọv. Rochas ga-aga nzukọ ndị gọvanọ - Onwuemeodo
[ "Naijiria", "Plateau steeti", "Amerika", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44791715
Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ: Amanyela Facebook iwu ikwụ pound 500,000
UK ga-eri ga-eri ụlọọrụ Facebook iwu ego ruru paụnds 500,000 maka ị da iwu nchekwa data na akụkọ ndị ọzọ dị mkpa n'ụtụtụ a.
2018-07-11T09:01:14Z
Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ: Amanyela Facebook iwu ikwụ pound 500,000
Akụkọ ndị dị mkpa. Buhari akatọọla ndị na-ata ya ụta Onyeisiala Mohammadu Buhari akatọọla okwu ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchị na-ekwu na ọgbara nkịtị n'ihe gbasara ogbugbu ndị mmadụ na Naịjirịa. Buhari kwuru nke a n'ọgbakọ ndọrọ ndọrọ ndị APC mere n'Ekiti Steeti ụnyaahụ iji kwado kayode Fayemi ịbụ gọvanọ steeti ahụ. Ụka Angịlịkan adụọla Buhari ndụmaọdụ Ụka Angịlịkan nọ na mba karịrị otu narị iri isii na ise n'ụwa niile Ndị ụka Anglican nke Nnewi Dayọsis agwala onyeisiala Buhari ka o chegharịa echiche n'atụmatụ ya ị pụtagharị n'ọkwa ọzọ. Nke a dị n'ozi ụkọchukwu Godwin Okpala wepụtara kwuo na ụfọdụ na-ahụ ya dịka ogbunigwe nchere oge. United Kingdom ga-eri Facebook iwu Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị Ngalaba na-ahụ maka nchekwa data na United Kingdom ga-eri ụlọọrụ Facebook iwu ego ruru paụnds puku narị ise maka ị da iwu nchekwa data Kọmishọna na-ahụ maka ozi kwupụtara nke a mana ụlọọrụ Facebook kwuru na ha ga-asa okwu n'oge na-adịghị anya. Egwuregwu: Gee nkeji nke ụtụtụ a: Ihe onyonyo nke taa:
[ "Facebook", "Naijiria", "Manchester City", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44798289
Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Ndị ụlọomeiwu Imo nwere nzụkọ ịchụda Madumere
Ọdịnihu Madumere dị n'aka onye ọkaịkpe n'Imo ebe a chụturu onye na-ekwuchite ọnụ ụlọomeiwu na Platu steeti taa.
2018-07-11T17:53:55Z
Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Ewepụla ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu na Platu steeti na onye ndu ndị ụlọomeiwu
Akụkọ ndị dị mkpa Okwu na-ewu n'elu soshal midia ọkachasị Twita bụ ihe gbasara ikikere nwaanyị ịzụta maọbụ rite ala n'aka nna ya n'ala Igbo. Ụfọdụ na-ekwu na ha kwenyere n'omenala a ebe ndị ọzọ na-ekwu n'oge eruola iji gbanwe ya bụ omenala. Ndị ụlọomeiwu Imo steeti nwere nzuko n'isi osote gọvanọ ha bụ Eze Madumere ekpebiela na ọ bụ ọkaikpe nke steeti ahụ ga-ekwu ma aga-achupụ ya n'oche ọchịchị n'ime ọnwa atọ maọbụghị. Cheta na ndị ụlọomeiwu nke Imo steeti kwuru na ha ga-achutu Madumere maka ebubo nrụrụaka ha boro ya. N'okwu yiri ibe ya Achụturu Peter Azi bụbu ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu nke Platu steeti n'ọkwa ya n'ehihie taa. Onye ọọ ewepụrụ bụ inyeisi ndị kachasị n'ọnụọgụgụ bụ Henry Yunkwap. N'akụkọ ofesi Praim minista mba Jamini na Onyeisiala mba Amerịka amaala aka dịka ha na-akwado ịga nzụkọ otu NATO na Brussels. Donald Trump na-ebo ụfọdụ mba n'ime ọgbakọ ahụ ebubo ịkpachi ego ha. N'Egwuregwu, Ebe niile tọgbọ chakoo ugbua na mba Briten ebe otu egwurewgwu ha na-akwado ị zute Kroeshia na asọmpị ga-egosi onye ga-abịa nso ị bu ikombaụwa. Anyị ga-ama onye ga-emerị ma ọ kụọ elekere asaa nke mgbede a. Gee nkeji nke mgbede a:
[ "Europe", "Amerika", "West Africa", "Bọọlụ", "North America", "Afịrịka", "Iko mba ụwa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44804056
Ụlọikpe atụọla ndị Boko Haram 113 mkpọrọ
Ndị a atụrụ mkpọrọ maka akpam ike iyi ndụ egwu gụnyere Zainab Idirs bụ nwụnye otu oke ọkpa Boko Haram akpọrọ Babawo Idris.
2018-07-12T06:59:31Z
Ụlọikpe atụọla ndị Boko Haram 113 mkpọrọ
Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Ụlọikpe pụrụiche na-ahụ maka ihe banyere iyi ọha egwu bụ nke Bekee kpọrọ "terrorism" tụrụ mmadụ 113 mkpọrọ maka ha dara iwu megidere iyi ndụ egwu. Ndị a amara ikpe nwetere oge dị icheiche mgbe akpụpụtara ha n'ụlọikpe pụrụiche dị n'ọdọ ndị agha Naịjirịa dị na Kaịnji, Naịja steeti. Iwu a sịrị ndị a dara gunyere ị so n'otu Boko Haram, izo ozi ga-enyere ndị ọrụ nchekwa obodo aka, inyere ndị otu oyi egwu aka ma soro mee ihe ga-eyi obodo egwu, nke butere ogbugbu mmadụ. 'A ga-agbaghara ndị Boko Haram chegharịrịnụ' Kedụ isi ụka Naijiria na Boko Haram? A malitela ikpe ndị Boko Haram ikpe Ndị ikpe a metụtara gụnyere Kabiru Mohammed, bu onye Kaban-Magadan, dị na Funtua, Katsina steeti. Eboro ya ebubo na azụru ya maka iji ogunigwe na ihe iyi egwu ndi ọzọ. Ndị nchekwa kwukwara na o so mkpa ike na Bama, Konduga, na Baga dị na Borno steetị nakwa Damaturu dị na Yobe steeti. Mohammed kwuru na ya banyere Boko Haram n'afọ 2013 ma bụrụ onyeisi. Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009 E kwuru na o du ndị ọzọ ga mwakpo mmadụ na obodo. Mohammed gbakwara ama na ọbụghị mmadụ kwanyere ya ịba Boko Haram, mana onwere mgbe ike ụdịrị ndụ ha na-ebi gwụrụ ya ike, nke mere ojiri tụfọ egbe ya wee gbaje Katsina. Anwụchịrị ya na 2015 n'ọdọ ụgbọala na Katsina. O kwenyere na ebubo asaa eboro ya nke mere eji tuọ ya mkpọrọ mkpụrụ ọka ruo afọ 30. Ụfọdụ ndị ọzọ atụrụ mkpọrọ bụ Adamu Mohammed dị afọ 22, ma bụrụ onye Gombe steetị. Eboro ya ebubo na o gburu mmadụ isi ma tụọ ogbunigwe n'ime ahịa. Mohemmed kwenyere na ya gburu mmadụ isi, ma kwuo na ọ bụ n'ime iyi ka ọ tụnyere ogbunigwe ahụ. Ya na onwe ya nwetere afọ 25 na mkụrụ ọka. Ihu foto ndị Boko Haram a na-achọ achọ Banzana Yusuf, bu onye Kano, nwetere afọ 20 maka etu aka ya siri dị na ntọrọ umu Chibok n'afọ 2014. Otu onye ndị DSS kpọrọ "ezigbote onye Boko Haram" bụ Sabo Kyari Mohammed, nwetere afọ isi na mkpọrọ. Ekwụrụ na Mohammed na-agbara ndị Boko Haram ama ma soro mee mwakpo akpọrọ "operation pointand kill" na Bekee na obodo ya bụ Misau di na Borno steeti. Ndi agha nwụchịri ya na nwụnye ya na umu ya na Platu steetị. Zainab Idris, bụ nwunye onye isi agha Boko Haram akpọrọ Babawo, sọ na ndị a amara ikpe. Anwụchịrị Zainab Idris ka ọ na-aga Sambisa, bụ ebe di ya nọ. Gọọmentị Naịjirịa na-akọwa na ha emeriela Boko Haram n'atụtụmatu Bekee kpọrọ "technical deafeat", mana otu a ka na-akpa ike na ọwụwa anyanwụ nke ugwu Naịjirịa. Ndị ọzọ na-akpa ike na Naịjirịa ugbua bụ ndị a na-eche na ha bu ndị Fulani na-achi ehi. Ọtụtụ mmadụ anwụọla na-aka ndị a na ebe dị icheiche na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: World Cup 2018: Kroeshia agbapụla Ingland n'ụzọ njem ị bute ikombaụwa Akụkọ dị mkpa na mgbede a Ala Igbo ebutela esemokwu n'etiti nwaanyị na nwoke
[ "Boko Haram", "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44804959
Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ: Miyetti Alla - 'Mkpebi unu adịghị anyị mma'
Ndị ọchị ehi na-akatọ mkpebi ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa-anyanwụ mere, Atụọla ndị Boko Haram mkpọrọ na akụkọ ndị ọzọ.
2018-07-12T08:54:20Z
Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ: Miyetti Alla agbarụọla ihu na mkpebi ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ
Akụkọ ndị dị mkpa. Ndị ọchị ehi agbarụọla ihu na mkpebi ndị Gọvanọ mpaghara ọwụwa-anyanwụ E gbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgụ dị n'etti ndị ọchị ehị na ndị ọrụ ugbo Otu Miyetti Allah nke mpaghara ọwụwa-anyanwụ agbarụọla ihu maka mkpebị ndị gọvanọ mpaghara ahụ mere na ha ekweghi ịmapụta oke ala maka ịzụ ehi. Onye ndu otu ahụ bụ Alhaji Gidado Siddiki kwuru na mkpebi a juru ha anya agbanyeghi mmekọrịta udọ dị n'etiti ha na Gọvanọ ndịa. Atụọla ndị Boko Haram dị 113 mkpọrọ ọka Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009 Ụlọikpe na-ahụ maka ndị na-eyi ndụ egwu atụọla ndị Boko Haram dị otu narị na iri na atọ mkpọrọ maka nsonye ha n'iyi ndụ egwu. Gọọmentị etiti mara ndị a ikpe n'ụlọikpe pụrụiche dị n'ogbe ndị agha Wawa Kaịnji nke Naịja Steeti. Na Mba ofesi Di na nwunye ndị Naịjirịa bi na mba Ịngland agbanahụla nchụlata dịka ha gwara ndị ọrụ njem na mba ahụ na a ga-ebi ụmụ ha ndị nwaanyị ugwu ma ha lọta na Naịjirịa Ụlọikpe ndị ọrụ njem na Mba Ịngland ga-eleba anya na mkpesa ha n'ime ọnwa Ọktoba nke afọ a. Egwuregwu: Mba Kroeshịa ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu gbapụ Ịngland iji rue agba ikpeazụ nke mbụ ha n'asọmpi Iko Mbaụwa ha mere nke a site na goolu ndị si n'aka Ivan Perisich na Mario Manzukich. Gee nkeji nke ụtụtụ a: Ihe onyonyo nke taa:
[ "Boko Haram", "Ezinụlọ", "Naijiria", "Ọgụ ndị na-achịehi", "Alụmdịnanwụnye" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44812263
Ntuliaka Ekiti: Ka o si aga na foto
Ntuliaka gọvanọ n'Ekiti na ha ebiri ọkụ. Lee ka o si aga ka ndị ọrụ Inec butere ihe ụfọdụ a ga-eji mee ntụliaka ahụ
2018-07-12T14:49:20Z
Ntuliaka Ekiti: Ekewala ngwa ntuliaka na Ekiti
E butele akwụkwọ ụfọdụ nke a kpọrọ 'non-sensitive materials'na bekee Ngalaba na-ahazi ntuliaka nke a kpọrọ Inec n'aha ịchafụ eburula akwụkwọ ụfọdụ nke a kpọrọ 'non-sensitive materials' na Bekee bata ịlamoko Ekiti dị n'Ekiti steeti maka ntuliaka ga-eme na steeti ahụ. Ndị abụ foto si ebe ahụ dịka BBC siri seta ya: Ntuliaka Ekiti Ntuliaka Ekiti Ndị ọrụ Inec gosikwara njikere ha dị ibido ihe ha bịara
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ekiti Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44812264
IPOB asaala Miyetti Allah
Otu Ipob ekwuola na okwu Miyetti Allah kwuru banyere nkwupụta ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ na ha agaghị awapụta ọdọ-ehi na mpaghara ha bụ okwu dị ime.
2018-07-12T16:21:23Z
IPOB: Okwu Miyetti Allah bụ ịma aka mgba
Ndị na-achọ nnwereonwe Biafra Otu na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob ekwuola na okwu Miyetti Allah bụ otu na-anọchite ndị ọchị-ehi kwuru bụ okwu ha chọrọ iji maja ma yie ndị Igbo na ndị ọzọ sị ọwụwa-anyanwụ bị n'ugwu-awụsa egwu. N'ozi nke odeakwụkwọ mgbasa ozi otu Ipob bụ Emma Powerful zitara BBC, Ipob kwuru na okwu ahụ bụ okwu dị ime ma marakwa ọgọdọ n'ihi ọ bụ mba ọgụ etinyere ọnụ n'ime akpa were na abaa. Igbo enweghi oke ala maka ịchị ehi - Ndị gọvanọ 'Taa gọọmentị ụta maka oke ogbugbu mmadụ' Ndị ọchịehi a ga-abụ ndị oyi egwu ka ha agaghị abụ? Ha kwuru na ha agaghị agba nkịtị ka o mezuo n'ihi na ha dị njikere ịwanye ndị ọbụla wakporo ndị sị ọwụwa anyanwụ na ọdọ-ahịa ha ji ọkụ n'aka. "Anyị chọrọ ime ka odoo anya na iko ndị ọbụla mekatara wakpo ndị Igbo ọbụla maọbụ ahịa ha dị n'ugwu-awụsa ji manye ka anyị ga-eji manyere ha." Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọ fọrọ ka nwataakwụkwọ a nwụọ site n'ọgwụ mere mmebi Ụlọikpe atụọla ndị Boko Haram 113 mkpọrọ Ncheta mbido Agha Biafra Gịnị ka ị kwesiri ima tupu ị nabata onye odibo N'ọsịsa ha nyere n'ụbọchị Wenezde banyere mkpebi ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ na ha agaghị enye ha ala maka iwu ọdọ-ehi, otu Miyetti Allah kwuru na ọ tụrụ ha na anya na ndị gọvanọ nwere ụdị mkpebi ma kwuo na o kwesiri ka ha bụrụ ndị na-atọ ezi mkpụrụ dịka ndị Igbo bikwa na mpaghara ndị ọzọ na Naijiria. Ndị otu Ipob kwuru na mkpebi ndị Gọvanọ ọwụwa-anyanwụ bụ iji gbochie ọgbaghara ma bụrụkwa ihe kwesiri na otu nọchitere ndị ugwu ( Arewa) na ndị chọrọ udo na Naijiria kwadoro.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44837409
'Boko Haram emerighị anyị'-Ndị agha Naịjirịa
Ndị agha Naịjiria ekwuola na ndị Boko Haram awakpoghi ha dịka akụkọ sị kwuo na mbụ.
2018-07-16T11:54:26Z
'Boko Haram emerighị anyị'-Ndị agha Naịjirịa
Ndị agha Naịjirịa Oteela ndị agha Naịjirịa jị awakpo ndị Boko Haram Ndị agha Naịjirịa ekwuola na akụkọ kwuru na a wakporo ndị agha na Bama dị na Boronu steeti ma nara ha ụgbọ agha ha bụ asị. Ha depụtara ihe a n'akwụkwọ sitere n'oche ọnye na-ekwuchitere ndị agha Naịjirịa ọnụ bụ Texas Chukwu. Ha kwuru na ya bụ akụkọ na-edughie ndị mmadụ ma bụrụkwa nke e gbasasiri karịa ihe merenụ. Ndị agha Naịjirịa kwuru na ha ji ohere a ekwe ndị bị n'ugwu Awụsa nkwa na onweghị ihe mebirinụ kama nchekwa ha ka kwụ chim. Boko Haram awakpoola Maiduguri ọzọ Egbuola ndị Boko Haram 5 na Sambisa Agha iyi ndụ egwu ebibeghị Ha kwuru na ọ bụ eziokwu na Boko Haram wakporo ha ma chọkwa ịnara ha ngwaagha ha mana ndị agha Naịjirịa meriri ha. Ha kwuru na ha gburu ihe ruru ndị otu Boko Haram 22, ebe ụfọdụ ndị egbe a gbara agba meruru ahụ gbara ọsọ. Ndị agha Naịjirịa kwuru na etu ọ dị ụgbua, na ha na-agba mbọ ịhụ na e jidere ndị otu Boko Haram ndị ọzọ gbara ọsọ. Ha kwukwara na ndị agha meruru ahụ site n'egbe a gbara ha mana ha na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ. Ndị agha Naịjirịa dọkwara ndị ntaakụkọ aka na ntị ka ha kpachara anya ha maka ịdughịe ndị mmadụ n'akụkọ ha enyochaghị enyocha. Cheta na akụkọ anya hụrụ mgbe ihe a mere kwuru na ndị Boko Haram anwuchiela ndị Naịjirịa 600 ma napụ ha ngwa agha ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: United Nations: Azụ ga-agwu na mmiri Anyị ekwenyeghị na mpụtara ntuliaka Ekiti, mmerụaka juru ya-PDP EFCC gwara Fayose: Anyị ga-ahụ n'oge na-adịghị anya
[ "Boko Haram", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44866100
A na-achọ nwata a kemgbe mbido Julaị
Ndị uweojii n'Anambara steeti ezipụtala ozi maka Nmachukwu Ebiowu bụ nwa esi n'ụlọakwụkwọ ya tọrọ.
2018-07-18T18:00:14Z
Anya hụrụ Nmachukwu kọrọ ndị uweojii
Nmachukwu Ebiowu Anya ahụbeghị Nmachukwu Otu nwa nwaanyị a kpọrọ Nmachukwu Ebiowu dị afọ atọ efuola n'obodo Okoti n'Anambara steeti. Dịka ndị uweojii si kwuo, Nmachukwu na nne ya bụ Juliana Ebiowu gara mmemme mmechi ụlọakwụkwọ ya na 'The Light International School'. Mgbe obere oge gachara, nne ya amalite ị chọ ya rue ugbua, ma ahụbeghị ya. Etu nwaanyị siri kwaa odibo ya mmiri ọkụ Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada Ụmụaka ruru puku 88 nwere ike ịnwụ n'oke agụụ Ezinaụlọ ya na-arịọ ndị ọha niile enyemaka ị chọta Nmachukwu e kwuru dị ọcha ma na-asụkwa asụsụ Igbo ọfụma. Anya ahụbeghị Nmachukwu Ndị uweojii kwuputara na akụkọ yiri nke a mere n'ụlọakwụkwọ pramarị ọzọ n'Amawbịa ebe ụmụnwanne abụọ bụ Chidera na Kamsiyochukwu Iloka si n'ụlọakwụkwọ ha fuo. Ha ji ohere a adọ ndị nnenanna nakwa ndịisiụlọakwụkwọ dị icheiche ha saa anya ma dịkwa njikere na ihe gbasara nchekwa ụmụaka ha na-eleta anya. N'akụkọ yiri ibe ya, ezịnaụlọ Ekene ka na-achọ nwa ha nwaanyị bụ Adaobi furu efu kemgbe ụbọchị Mee 1 na Legọs. Ozi a na-ewu ewu n'elu soshal midia bụ ndị mmadụ na-achọ otu nwata nwaanyị akpọrọ Elo Ogidi ebe nne ya na nna ya malitere ị chọ ya mgbe ha gbasara ụka n'ụbọchị Julaị nke asatọ na Legọs. Ndị uweojii na-arịọ na o nwee ndị mmadụ ma ihe gbasara ụmụaka a kpọọ ha na 08075690784 maọbụ 07039194222.
[ "Naijiria", "Anambra Steeti", "Ụmụaka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44882538
Dọkịnta Bumbum: Aka akparalanụ dibia otele ukwu
Aka akpalara Dọkịnta Furtado bụ onye nwaanyị chọrọ otele ukwu nwụnahụrụ n'aka ha na Brazil.
2018-07-20T06:48:37Z
Dọkịnta Bumbum: A nwụchiela dibia otele ukwu
Furtado na Brazil Dọkịnta Furtado sị na ọnwụ nwaanyị ahụ dị nwute Ama a gbaara ndị uweojii emela ka ha nwuchie dọkịnta Denis Furtado bụ onye asị gbụrụ nwaanyị chọrọ otele ukwu. Ka ọ dị ụgbụa, Furtado nọ na ụlọ mkpọrọ ha na Rio de Janeiro ezuru nwaike. Lilian Calixto bụ onye bịara ka o nye ya ukwu sara mbara nwunahuru ya n'aka maka ogwu asị na-ọgbara ya nke kwesiri inye aka ka otele ya buo ibu. A ga-ekpe Denis Furtado ikpe ọchụ maka nke a. Dọkịta egbuola nwaanyị otele ukwu gbalaga Buhari akpọghachiela onyeisi NHIS Akụkọ kọrọ na-ejidekwuru nne Furtado bụ onye a na-eche n'aka ya dị na ya bụ ọdachi. Ndị na-enyocha ya bụ okwu sị na Dọkịnta Furtado gara ịrụ Calixto gbara afọ 46 ọrụ n'otele ya na-ụlọ be ya mgbe ọgwụ ọ gbara ya bidoro ịnye ya nsogbu. Dọkịnta Furtado mere ngwa ngwa bụrụ Calixto gawa ụlọ ọgwụ bụ ebe ọ nọ nwụọ, dịka ndị uweojii si kwuo. Akụkọ kwuru na mgbe o ruru na ya bụ ụlọọgwụ na obi bidoro ịkụsị nwaanyị ahụ ike. Mgbe ahụ ka Furtado matara na ekwu adagharịala were rịe mbọmbọ ọsọ. Ụbọchị Wednezde ka ọkaiwu Furtado kwuru n'aka Furtado dị ọcha, na ọ bụ maka obi mmapụ ka o jiri gbaa ọsọ. Ihe nkiri o kwuru okwu ka ejidechere ya ụnyahụ Furtado sị na onwu Calixto dị nwute maka na ọbụghị taa ka ya bụ oke enwe tawara akwụ n'ohia. Lilina Calixto dị afọ 46 Ọ sị na ya arụọla ya bụ ọrụ ihe uru ugboro 9,000 na-ekwukwa na iwu Brazil nabatara ụdị ọrụ ahụ. A makwa Furtado ama na Brazil nke bụ na mmadụ ruru 650,000 na eso ya n'instagram. Calixto si be ya na Kuiaba gawa sentral Brazil ụbọchị Satọde ịme ka otele ya bukwuo ibu bụ ebe ọ nọ zute onwu ya were gbahapụ ụmụ abụọ ọmụrụ. Ndị uweojii kpụrụkwara enyi nwaanyi Furtado bụ onye ha na-eche na ọ na-enyere ya ka n'ọrụ ahụ. Ndị ụlọọrụ na ahụ maka ahụike na steeti Rio de Janerio sị na ha amalitele nnyocha na ya bụ okwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị Igbo a ga-ege Ipop nti maka ntuliaka 2019? Akpụpụla ụmụafọ Naịjirịa ise ụlọikpe Ndị ojiegbeezu awakpuola ebe obibi n'Ọnịcha
[ "Brazil", "Ọgwụ", "Ahụike", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44904578
A gbaala Joe Igbokwe akwụkwọ n'ụloikpe maka ihe o kwuru
Joe Igbokwe arịọla arịrịọ maka okwu o dere gbasara Nyesome Wike maka ọzụzụ mkpebi mana ikpe ka di ya n'isi.
2018-07-20T15:46:46Z
Anyị anabataghị arịrịọ Joe Igbokwe chaa chaa - ọkaiwu Adegboruwa
Joe Igbokwe Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuchiri otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC na Legos Joe Igbokwe, odeakwụkwọ mgbasaozi otu APC na Legọs steeti abaala mmiri ọkụ maka ozi o dere n'elu Facebook n´ụbọchị ole n'ole garaaga. Otu okaiwu aha ya bụ Ebun-Olu Adegboruwa gbara Igbokwe akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu nke Lagos maka na n'ụbọchị 16 n'ime ọnwa nkea, Igbokwe boro gọvanọ na-achị Rivers steeti bụ Nyesome Wike ebubo n'elu facebook na ọ zụrụ mkpebi n'ụlọikpe ụkwu nke Abuja maka okwu gbasara 'Election Petition Appeal' na Bekee, ha zara n'Abuja. Ortom: Ihe m jiri kpụpụ Miyetti Allah ụlọikpe Igbokwe arịọla mgbaghara n'elu Facebook maka ozi a. O dere na obi gbariri ya agbari maka ozi nkea o dere, na kwa na ọ bụghị echiche ya ịkparị ndị nọ n'isi oche ụlọikpe makana ya akwanyere ha ugo oge niile. Mana Adegboruwa gbadosiri ụkwụ ike na ya agaghị anabata arịrịọ a Igbokwe dere. Ọ gwara onye ntaakụkọ anyị n'elu ekwentị na arịrịọ Igbokwe dere ejubeghị ọnụ nke ihicha mkparị ọ kparị ndị na-arụ ọrụ okaikpe na ọkaiwu na Naịjirịa. Ebun-Olu Adegboruwa bụ okaiwu ama ama na Legos N'ọnụ okwu ya: "Iwe anyị na ihe Joe Igbokwe dere bụ makana ozi ya emeela ka ndị mmadụ kwụsị ịnwe ntụkwasị obi siri ike n'ihe niile gbasara ndị ọkaikpe na ọkaiwu n'ala anyị. Cheta kwa na ndị a bụ ndị ta ahụhụ ọtụtụ afọ ị gụ akwụkwọ tupu a bụrụ ndị ọkaikpe maọbụ okaiwu" Adegboruwa kwuru na echiche ya abụghị ka Igbokwo ta ahụhụ na mkpọrọ maọbụ kwụ nha, o kwuru na ọ chọ ka Igbokwu kwupute n'ụlọikpe na Nyesome Wike azụghị mkpebi na ụlọikpe dị na Naịjirịa. Mgbọ niile anyị mere inweta Joe Igbokwe n'elu ekwenti maka ị sa okwụ a Adegboruwa kwuru amụpụtaghị mkpụrụ. Ọ zaghị ekwentị ya oge BBC kpọrọ ya. Ọzabeghịkwa ozi anyị degara ya site n'ekwentị ya. Akụkọ ga-amasị gị Nwoke o kwesịrị inyere nwunye ya aka n’ezinaụlọ? Mmadụ 164 tọrọ na Russia amalitela njem ịlọta Naịjirịa Dọkịnta Bumbum: Aka akparalanụ dibia otele ukwu
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ikpe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44904580
Akụkọ ndị kachasị taa: Erighị nri abalị n'oge na-ebute ọrịa kansa
Erighị nri abalị n'oge na-ebute ọrịa 'cancer' na kwa ikpe di n'isi Joe Igbokwe so kwa.
2018-07-20T19:19:30Z
Akụkọ ndị kachasị taa: Erighị nri abalị n'oge na-ebute ọrịa kansa
Erighi nri abalị n'oge na-ebute ọrịa I makwana na erighị nri abalị n'oge na-ebuite ọrịa ? Otu kpọrọ onwe ha Barcelona Institute for Global Health na bekee kwuru na nchọpụta ọhụrụ ha mere, na ọ na-ebute izi agede nke a kporọ 'prostrate cancer' maọbụ izi ara nke bụ 'breast cancer'. Ọbịara ije ma-ụna n'ala Rọshịa Naịjirịa na-atụ anya nlọta mmadụ otu narị iri atọ na-anọ tọrọ na Roshia ga-alaghachị azụ na Abuja taa. Ozi na-eru anyị bụ na abaala ụgbọelu na kwa na ha ga-efadata na Abuja na abalị a. Joe Igbokwe ga-aza ikpe di n'ishi ya Otu okaiwu aha ya bụ Ebun-Olu Adegboruwa agbaala Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwụrụ APC na Legos akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu nke Lagos maka na o boro gọvanọ Rivers steeti bụ Nyesome Wike ebubo n'elu Facebook na ọ zụrụ mkpebi n'ụlọikpe kachasị n'Abuja. Joe Igbokwe arịọla arịrịọ mana Adegboruwa gbadosiri ukwu ike na ya agaghị anabata arịrịọ a Igbokwe dere. Son ebiyeela aka n'akwụkwọ N'egwuregwu, ọgba bọọlụ Son Heung-min nke otu Tottenham ebinyeela aka n'akwụkwọ ọhụrụ nke otu ya ruo afọ 2023. Son Heung-min banyere otu Tottenham n'afọ 2015. Ugbua o nyeela goolu ruru iri anọ na asaa. Gee nkeji anyị Lee ihe nkiri anyị
[ "Rọshia", "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Nri", "Nchekwa nrị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44903791
Di na nwunye irikọ nri: Gịnị ga-eme nwoke Igbo ajụ nri?
Lee ihe nwere ike ime nwoke Igbo agbaa ọsọ iri nri nwunye ya siri na mpụtara ya n'omenaala Igbo.
2018-07-21T18:41:55Z
Di na nwunye irikọ nri: Gịnị ga-eme nwoke Igbo ajụ nri nwunye ya siri?
N'ala Igbo, di na nwunye na-erikọ nri n'otu efere. Dịka Ikechukwu Asikadị na ọtụtụ ndị ọzọ ha na BBC Igbo nwere mkparịtaụka si kwuo, ọ na-egosi ịhụanya na ịdịnotu. Asikadị sị, "Ọ na-adị mma ka nwoke na nwunye ọ lụzuru ọfụma na-erikọ nri." Lee uwe ndị Igbo na-eyi aga igba nkwu Nwoke o kwesịrị inyere nwunye ya aka n’ezinaụlọ? Lee nri ogbenye 10 ọgaranya na-erizi Mgbe ụfọdụ, enweghị ohere, amaghị esi nrị, ike ọgwụgwụ na ọrịa nwere ike ime nwoke na nwunye aghara ịnọkọ rie nri. Mana ihe ndị a bụ obere okwu. Di na nwunye irikọ nri na egosi ihunanya Nke bụ okwu bụ nwoke Igbo ịjụ idetụ ire na nri nwunye ya siri iji gosi iwe ya. Dike Asikadi siri kọwaa, iwe maka nnupuisi nwunye ọkachasị nwaanyị ịgba n'ezi, nwere ike ime ka nwoke ghara isonye nwunye ya rie nri. Uchenna Omeke kwukwara otu okwu ahụ sị, "ọ chọputa na nwunye ya gbara n'ezi." Di na nwunye irikọ nri ọnụ na-egosi ịhụnanya Nwaanyị lụrụ di ịyị ọyị nwoke ọzọ bụ arụ kwọ nwa n'ala Igbo. E jighị ntị anụ ya. Nke a bụ n'ihi dịka Asikadi siri kwuo, nwaanyị ịgba n'ezi na-egbu mmụọ nwoke ọkachasị ma ọ bụrụ na nwoke ahụ hụrụ ya n'anya ma na-emekwara ya ihe niile ọ chọrọ. Nke ka nke dịka Oriakụ Celine Ekere siri kọwaa, na mpaghara Igbo ụfọdụ, nwoke riri nri nwunye ya na-agba n'ezi ji ọnwụ ụgwọ, ma ya ma nwa ha mụtara. Ekere, onye bụ onye Ezaa n'Ebonyị steeti kwuru na 'Ọ bụrụ na nwaanyị gbaa n'ezi ma ọ lụọ di, ga sie nri nye di ya, di gị rie ya, nwa gị ga-anwụ. Di gị ga-ebido rịawa ọrịa. Oge ụfọdụ, ahụ ga-ejide nwa gị. O nwere ike, aka na ụkwụ ya azaa. Tupu ị mara ihe ga-eme, ọ nwụọ." Dika ilu Igbo na-ekwu sị, 'onye mara asụ, sụọ a n'ikwe. Onye amaghị asụ sụọ n'ala. Akụkọ ga-amasị gị: Dọkịta egbuola nwaanyị otele ukwu gbalaga Gịnị mere e ji ezi ọha ndị a na-enyocha maka mpụ na Naịjirịa?
[ "Omume", "Ezinụlọ", "Naijiria", "Omenala", "Alụmdịnanwụnye" ]
https://www.bbc.com/igbo/44915051
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Flying Eagles enweela nnukwu mmeri maka AFCON
Flying Eagles enweela nnukwu mmeri na kwa ihe Gowon kwuru gbasara Miyetti Allah so n'akụkọ a.
2018-07-22T07:44:35Z
AFCON: Flying Eagles enweela nnukwu mmeri
Flying Eagles ga-asọmpị na AFCON N'egwuregwu, otu Flying Eagles emeriela Mauritania ọkpụ ise na-asataghi ihe n'ime asọmpi ga-ahọpụta ndị ga-agba n'asọmpị iko mpaghara Afirika n'afọ 2019. Nkea pụtara na ha ga-eso n'ime ala dị iche iche ga-asọmpị AFCON n'afọ na-abịa. Ọ bụ n'ala Niger ka asọmpị a ga-ebido n'ime ọnwa Febuwarị. Miyetti Allah kwesiri ịza ajụjụ - Gowon Onyechiburu Naịjirịa dịka onyeisiala n'oge garaaga bụ Yakubu Gowon ekwuola na obi gbariri ya agbari maka ọtụtụ mmadụ nwụrụ n'aka ndị na-achị ehi buru egbe na steeti di iche iche n'afọ a. N'ime ogbakọ Gowon na gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Ortom mere, o kwuru na oge eruola ndị ọrụ nche dị iche iche n'ala Naịjirịa gbara onyeisi ndị otu Miyetti Allah ajụjụ ọnụ ga-akọwa ihe mere udi ihea na-eme n'ala a. O'diakpo Obire apụọla na APC Akụkọ pụtara na Delta steeti ugbua na-ekwu na O'diakpo Obire bụbụ onye na-azọ ọkwa ọchịchị dịka gọvanọ Delta steeti n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC ahapuọla patị APC gawa otu Progressive Peoples Alliance. Obire kọwara na ọ hapụrụ APC Delta steeti maka ọtụtụ nsọgbu na-emebi ihe n'ime patị a na steeti ahụ. Okpomọkụ na-egbu nmadụ na Japan Gọọmentị ala Japan na-adọ ndị ala ha aka na ntị ka ha zọ ishi ha maka nnukwu okpomọkụ na-egbu mmadụ ugbua n'ala ahụ. Akukọ pụtara n'ala ahụ ugbua na-ekwu na mmadụ ruru iri atọ anwụọla maka okpomọkụ a. Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a Lee ihe nkiri anyị
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44918803
SARS: Ndị uweojii anọ abanyela n'ofe dị ọkụ
A chụọla ndị SARS mmadụ anọ ma kpụpụ ha ụlọikpe maka ezumohi na ntọrị.
2018-07-22T18:08:33Z
SARS: Ndị uweojii achụọla ndị otu ha mmadụ anọ?
Osote onyeisi ndị uweojii nọ na Zoonu 2 dị n'Ikeja Legos bụ Adamu Ibrahim akwadola ka a chụlaa ndị uweojii SARS mmadụ anọ maka ebubo na ha zuru ohi nakwa mkpamkpa ndị ọzọ. Otu onye uweojii welitere isi bụ Abayomi Shogunle depụtara ọchụchụ ha n'akara twitter ya. Shogunle dere aha ndị a chụụ dịka Sgt. Adeoye Adekunle, Sgt. Adekitan Adebowale, Sgt. Agbi Lucky na Sgt. Odighe Hehosa. Mana onye nkwuchiteọnụ zoonu ahụ bụ Dolapo Badmus gwara ndị ntaakụkọ na a kpụpụkwara ha ụlọikpe maka iji egbe gaa ohi, ịtọrị mmadụ, ijide mmadụ n'ike nakwa imekpa ndị mmadụ ahụ nakwa iyi ndị mmadụ egwu. Badmus kwuruna otu kọmitii e kpokobara inyocha ihe ha mere bụ ndị kwuru ka a chụọ ha site na nyocha ha mere maka akwụkwọ ndị mmadụ dere megide ha. Ọ kọwara na ndị dere akwụkwọ ahụ bụ Chukwudi Godwin Odionye onye e ji aha 'Bishọp" we mara ụbọchị Mee 2, 2018. #EndSARS: Mgbanwe ọ bịala na ngalaba uweojii a? Humphrey Nwosu: Agaghị m abịanwu emume ncheta Juun 12 Etu esiri jide ndị SARS mere mpụ N'okwu ya: "Onye dere akwụkwọ ahụ kwuru n'ụbọchị Juun 4, 2017, ọ nọ na be ya oge mmadụ anọ ji ege wụbatara be ya ịnwụchi ya na ọ na-ebu amụma ụgha na ihe ịrịbaama ụgha. "Oge ha nwụchiri ya, a kpọrọ ya gaa n'otu ụlọoriri na nkwari ebe ha dobere ya ma yie ya egwu na a ga-egbu ya ma ọ bụrụ na o meghi ihe ha kwuru." Ọ gara n'ihu kọwaa na "Ụbọchị Juun 5, 2017, a kpọrọ ya gaa n'ụlọakụ ebe ha mere ha ka o tinyere ego ruru nde naịra asaa n'ụlọakụ otu n'ime ha. "Oge anyị nwetara akwụkwọ ahụ, osote onyeisi ndị uweoji nyere iwu ka e lebaa ya anya." Badmus kwuru na nyocha ahụ gosiri a onweghi usoro ziri ezi nke e soro iji nwụchi Chukwudi. "Ndị SARS mmadụ anọ ahụ tọọrọ nwoke ahụ n'ụlọ ya ma jide ya megide iwu maka onwe ha" dịka Badmus si kwuo. O kwuru na onyeisi ha enyela iwu na ha agaghị anabata agwa ọbụla na-ebuda aha ụlọọrụ ha maọbụ na-emchu ha ihu na mba ụwa. Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nwụchi ahụ na twitter Adrian kwuru na a ka ga-ahapụ ha etu e kwuo na e jideburu otu onye bụ Festus nke e ji Ijaya mara mana ọ ka na-emekpa ndị mmadụ ahụ. Segalink kwuru na ntaramahụhụ ha kwesiri ịka mka na ọ bụ gọọmenti nyere ha egbe ha jiri zuo ohi. Timothy Atori kwuru na nke a kwesiri ikuziri ndị uweojii ndị ọzọ ezi ihe ma kwuo ka Chineke gọzie ndị uweojii Naịjirịa ma gọziekwa Naịjirịa. O teela aka a na-eti mkpu na twitter nakwa na ngwa soshal midia ndị ọzọ ka e kpochie ndị SARS site n'akara #EndSars. Akụkọ ga-amasị gị: Ndị Igbo a ga-ege Ipop nti maka ntuliaka 2019? Gịnị mere ụmụnwaanyị ji eghe ntutu? 'Ndị mmadụ kọrọ m ọnụ nwa' - Nne ejima atọ
[ "Legọsị", "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44917604
Ekweremadu chọrọ nhatanha na nkesa ọkwa gọọmentị
Ike Ekweremadu ekwuola na ịnwe nhatanha na nkesa ọkwa dị ịcheiche ga-enyeaka bute udo na Naịjirịa.
2018-07-22T18:10:38Z
Akụkọ ndị dị mkpa: Ekweremadu chọrọ nhatanha na nkesa ọkwa gọọmentị
Akụkọ dị mkpa taa Ike Ekweremmadụ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na mahadu Naịjirịa dị n'Enugu Osote onyeisi sineti bụ Ike Ekweremmadu ekwuola na otu ụzọ a ga-esi kwalite udo n'ezi obibi na Naịjirịa bụ ịkekọrịta ọrụ, ọkwa dị ịcheiche nakwa ngalaba n'ụzọ dị nhatanha. O kwuru na atụmatụ a ga-ebute udọ karịa ịkwe naanị nkwa nkịtị. Ndị uweojii na Legọs anwụchiela mmadụ ise bụ ndị isi otu ndọrodọrọ PDP na Legọs maka ọnwụ otu n'ime ha. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legos kwuru na ọ bụ ọgụ na mgba mere na nzụkọ pati ahụ riri ndụ nwoke ahụ. N'Afrịka, Ụzụ akwa n'atụ na mba Sawụt Afrịka ebe ndị o ji egbe egbu wakporo ma gbuo mmadụ iri n'otu bụ ndị na-anya ụgbọala tagzi. Ndị uweojii na mba ahụ kwuru na a wakporo ha mgbe ha si akwamozu onye otu ha alọta ma kwuo na mmadụ anọ n'ime ha nọ n'ụlọọgwụ. N'Egwuregwu, Alex Iwobi bụ onye ọgba bọọlụ Naịjirịa na-akwado ibinye aka n'ime akwụkwọ ọrụ ọhụrụ ga-eru afọ 2022 n'otu Arsenal. N'otu aka ahụ otu Leicester city ajụla ịtọghapụ Ahmed Musa ka o sonye n'otu Al Nasr nke Sawudi Arebịa. Gee nkeji nke mgbede a: Ihe onyonyo nke taa:
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "South Africa", "Arsenal", "PDP (People's Democratic Party)" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44920964
'Anambara dị njikere ma n'ụtụtụ ma n'abali'
Kọmishọna na-ahụ maka mbaraezi n'Anambara bụ Michael Okonkwo ekwuola na ha dị njikere mgbe niile maka idemmiri na-abịa.
2018-07-23T05:42:28Z
Obi rue gị ala, gọọmentị Anambara zuru ka eme - Okonkwo
Ide mmiri Okonkwo gwara BBC Igbo n'ekwentị na ugbua abụghị mbụ a na-ekwu okwu ide mmiri n'Anambara steeti. N'ọnụ ya "eso m na kọmitii na-ahụ maka ịgbochi idemmiri, ama m ebe e dobere ngwa a ga-enye ndị mmadụ ma idemmiri kwobe". O kwukwara na ndị mmadụ ekwesighị ịtụ egwu n'ihi na gọọmentị anambara steeti dị njikere oge niile. Ụzọ ise ị ga-esi gbalahụ oke idemmiri Idemmiri Katsina: Nwaanyị lụrụ di na Fraide, lọkwute ya na Satode, mmiri eburu ya ụbọchịụka Anyị dọpụtara ụfọdụ mmadụ ebe ụlọ ha dagidere ha- Waziri Cheta na ndị ụlọọrụ gbatagbata nke a kpọrọ 'National Emergency Management Agency' (NEMA) na Bekee, kwuru na oke idemmiri ga-enye ndị mmadụ nsogbu n'Anambara steeti n'afọ a. Ndị Nema kwuru na idemmiri a ga-emetụta mpaghara ime obodo ndị dịka Njikọka, Ayamelụm, Ọwụwa-anyanwụ Anambara, Anaọcha, Agụata, Ugwu Idemili, Ọgbarụ, Ugwu Ọnịcha, Ugwu Orumba, Ọdịda-anyanwụ Anambara, Ndịda Ọnịcha nakwa Dunukọfịa. Onye na-arụ ọrụ dịka onye nchịkọta otu Nigerian Hydrological Services Agency nke ngalaba Federal Ministry of Water Resources bụ Olayinka Ogunwale, kwuputara maka idemmiri a n'Ọka, ebe ha na-eme nzukọ ha na-eme kwa afọ, ebe a na-akọwa olileanya gbasara idemmiri a kpọrọ 'Annual Flood Outlook (AFO)' nke 2018. Clement Nze bụ onye nọchitere anya Ogunwale na nzukọ ahụ, kpọkuru gọọmentị Anambara nakwa NEMA, ka ha gbalịa hụ na ha mere ihe ga-ebelata oke idemmiri. Ogunwale kwuru na oke idemmiri abụghị ihe a ga-akwụsịnwu na Naịjirịa, mana ịkwado n'oge ga-enye aka ibelata mkpamkpa o nwere ike ịkpa. O kwukwara na osimiri na-asọbiga oke, oke mmiri ozuzo, na ihe ndị ọzọ dịka ndị mmadụ ịwunye atịtị n'ime ọwara-mmiri, na-etinye aka ibute oke idemmiri. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Isi akụkọ mere taa: Mmadụ 20 ka na-efu na idemmiri Katsina steeti. Osibanjo gara Kastina maka ide mmiri Mobil na-akpaso anyị agwa ka ndị amaghị oke ruru ha - Ndị a chụrụ n'ọrụ
[ "Gburugburu", "Naijiria", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44927533
Unizik: Iwe na-ewe anyị n'ọnwụ nwanne anyị - Ụmụakwụkwọ
Ụmụakwụkwọ mahadum Nnamdi Azikiwe na-eme ngagharị maka ọnwụ otu onye n'ime ha tụbọrọ n'ụlọakwụkwọ.
2018-07-23T17:55:27Z
Unizik: Anyị chọrọ ka a kutuo ụlọọgwụ ụlọakwụkwọ anyị maọbụ rụgharịa ya - Nwaakwụkwọ
Ngagharị iwe Unizik Iwe na obi mgbawa ka ụmụakwụkwọ mahadum Nnamdi Azikiwe ji nata ọnwụ otu onye n'ime ha bụ Francis Madubuobi. Francis nwụrụ n'ụzọ ebe a na-ebuga ya ụlọọgwụ ebe ọ tụbọsịrị ka ọ na-egwu egwuregwu bọọlụ nkata dịka otu nwaatakwụkwọ si kwuo. O kwuru na iwe ụmụakwụkwọ abụghị naanị maka ọnwụ ahụ kama maka na ụlọọgwụ dị n'ụlọakwụkwọ ahụ enweghị ngwọọrụ iji leta ya mere o jiri nwụọ tupu e ruo ụlọọgwụ ọzọ. Mahadum Covenant dara iwu - ọkaiwu Ha gbanyere m mmiri mmebiri emebi n'ahụ - Nwata akwụkwọ Ọchụchụ ọkammụta OAU: Ọ bụ ihe kwesịrị- Ụmụnwaanyị Nwata akwụkwọ ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na nke a abụghị mbụ nwataakwụkwọ na-anwụ maka na ụlọọgwụ ahụ enweghi ngwọọrụ. Ụmụakwụkwọ jiri maka ọnwụ Francis we pụa n'igwe igosi iwe ha mana onyeisi ụlọakwụkwọ ha ekweghi ka ha mee ngagharị ha n'ime ụlọakwụkwọ. Nke a mere ha jiri pụọ n'ezi ime ngagharị ahụ mana nwataakwụkwọ ahụ kwuru na onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ kpokobara kọmiti inyocha ka Francis anwụrụ n'ime ụlọọgwụ ha ka ọ bụ n'ụzọ. Ụmụakwụkwọ ahụ na-ekwupụakwa iwe ha na twitter. Mhiz Sophia depụakwara maka ọnwụ ahụ n'akara twitter ya. Francis nọ n'afọ ikpeazụ ya ebe ọ na-agụ gbasara ụmụanụmanụ a na-akpọ 'Microbiology' na Bekee. Onye nkwuchiteọnụ ụlọakwụkwọ ahụ bụ Emmanuel Ojukwu kwuru na nwata akwụkwọ nwụrụ site n'ọrịa obi. Ọ kọwara na ụmụakwụkwọ amaghị na anaghị agba onye tụbọrọ site n'ọrịa obi mmiri mana ndị ụlọọgwụ ụlọakwụkwọ ahụ kwuru na nwaata ahụ anwụọla tupu ha ebute ya n'ụlọọgwụ. Ojukwu kwuru na ọ bụ nnukwu ihe mwute nye ezinaụlọ na ụlọakwụkwọ ahụ maka na Francis kwesiri ile ule ikpeazụ ya taa we gụsịa. Mana o kwuru na ọ bụghị ụlọakụkwọ ka ụta dịrị n'ọnwụ Francis n'ihi n;ọnwụrụ ebe ọ tụbọrọ dịka ndị ọrụ ahụike ha siri kwuo mana ụlọakwụkwọ ahụ eguzobela kọmiti ga-eleba anya n'ọnwụ Francis. Akụkọ ga-amasị gị: Mmadụ 257 anwụọla na mberede ụgbọelu Legos nwere ijiegbezu 1315, ntọ 392 Ndị Fulani na-achi ehi egbuola mmadụ 2,000
[ "Naijiria", "Ngosi iwe", "Anambra Steeti", "Ngosi" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44934492
Bukola Saraki: Ndị uweojii chọrọ ịkatọ aha m
Saraki na-agọ ụkwụ na aka ya maka ebubo na oku ndị uweojii na-akpọ ya n'igwe okwu Twitter.
2018-07-24T05:59:18Z
Bukola Saraki: Ndị uweojii chọrọ ịkatọ aha m
Saraki na Idris Onyeisi ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa bụ Bukola Saraki ekwuola na oku ndị uweojii kpọkwara ya ọzọ bụ ụzọ ha ji chọọ ịkatọ aha ya n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị. Ndị uweojii kpọrọ Saraki ọzọ ka ọ bịa kwuo etu ohi e zuru n'ụlọakụ Offa ma gbuo ihe ruru mmadụ 17., si metụta ya; ma aka ya ọ dị ya ka ọ dịghị ya. Cheta na ndị uweojii kpọburu ya ụdịrị oku a n'ọnwa Juun, ka ụfọdụ ndị e jidere maka ohi a kpọrọ aha ya, na ọ ma maka ya bụ ohi. Saraki kwuru sị na oku a onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris kpọrọ ya bụ ụzọ e si enweta akara ọma na ndọrọndọrọ ọchịchị, nke Bekee kpọrọ 'cheap political points'. Bukola Saraki: Anataghị m ngarị ọbụla Saraki: egwu ndị uweojii adagharịala Saraki azaghachila ndị uweojii Ka ndị uweojii kpọkuru ya oku ọzọ, Saraki kwuputara okwu a site n'akwụkwọ Yusuph Olaniyonu bụ onye ndụmọdụ ya pụrụiche nakwa ọnụ na-ekwuchitere ya, depụtara ụnyaahụ. Saraki kwuru sị "ndị uweojii ejirila ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa mpụ na nrụrụaka mebie nyocha ha na-eme maka ohi e zuru n'Offa. "Ha atụgharịala ya ịbụ ngwaọrụ pati nọ n'ọchịchị ji emegide ndị ha na-ahụta dịka ndị iro ha; ihe ha ji ata ndị mmadụ amusu ma mebie aha ha ijiri aka ha họrọ n'elu ikpookwu (platform) nke ha ga-eji chụọ ebumnobi ha, nakwa ụzọ ha si emegide ndị ọ ga-abụ ha pụọ n'APC o mebie ohere pati a na ntuliaka na-abịa." Saraki kwukwara na ndị uweojii ekpebiela ndị a na-enyo enyo ha ga-akpọpụta n'ụlọikpe n'Ilorin, Kwara steeti na Wenesde, site na ndụmọdụ Mohammed Etsu bụ 'Director of Public Prosecution (DPP)'. Lee ihe Saraki dere na Twitter gbasara oku a kpọrọ ya. O kwukwara na ọ bụ usoro e jiri chọọ ịkwụsị atụmatụ ndị mmadụ na-ekwu na ụfọdụ ndị ụlọomeiwu ukwu na nke nta na-achọ ịpụ n'otu pati All Progressives Congress (APC). O kwuru na a sị na ọ bụrụ na anwụchie ya n'etiti Tuusde na Wenesde, na ọ ga-egbochi ndị mmadụ isi n'APC pụọ. O kwuru na oku a kpọrọ ya agaghị egbochi ihe ọbụla gbasara ọnọdụ ya maka ihe ga-eme na ntuliaka 2019. O kwuru na ndị na-akwado ebubo ọhụrụ a gbasara ohi Offa, ga-ada maka na aka ya dị ọcha. Saraki kwuru na "eziokwu ga-emeri". Akụkọ ndị ga-amasị gị: Oke idemmiri na-abịa n'Anambara - NEMA Unizik: Iwe na-ewe anyị n'ọnwụ nwanne anyị - Ụmụakwụkwọ Aga m agwa Buhari chụpụ Ngige - Oshiomole
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Bukola Saraki" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44934494
Ọpụpụ ndị omeiwu: 'Anyị kwụ chịm' - APC
N'agbanyeghi na Saraki, Dino Melaye nakwa sinetọ ndị APC ruru mmadụ 15 agafeela otu pati PDP, APC na-ekwu na ha kwụ chịm.
2018-07-24T07:29:19Z
Ọpụpụ ndị omeiwu: 'Anyị kwụ chịm' - APC
Ọkọlọtọ otu APC N'ime akwụkwọ ozi onye odeeakwụkwọ mgbasa ozi otu APC bu Bolaji Abdullahi depụtara, o kwuru na otu ha kwụ si ike. O kwuru na n'izuụka ole na ole gara ka ha na-agbaghrị ị hazi ihe gbasara ndị bu iwe n'etiti ha n'ụzọ dị mma. Mana ọpụpụ ọtụtụ mmadụ mere taa gosiri na ndị ahụ pụrụ apụ bu ihe ọzọ n'uche eso ha. Bukola Saraki asaala oku ndị uweojii na-akpọ ya Saraki na Ekweremadu: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mgbochi ha Ekweremadu: Ike agwụla ndị ụlọ ome iwu N'ọnụ ya "Nsọpụrụ anyị nwere n'ebe ndị Naịjirịa nọ mere n'anyị ga-aga n'ihu ị hazi pati anyị na ntuliaka nke 2019 n'abịa" Cheta na elekere ole na ole gara na onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki kwupụtara na ndị omeiwu ruru mmadụ 15 ahapụla APC. Saraki gụpụtara akwụkwọ ij maa ọkwa ahụ n'ụlọomeiwu, taa bụ Tuusde, Julaị 24. Ka nke a na-eme, n'ụlọomeiwu nke nta (House of Representatives), ihe karịrị mmadụ 33 hapụkwara otu APC gafee PDP, ebe mmadụ anọ banyere ADC. Ndị PDP na aṅụrị n'ime ụlọomeiwu mgbe ndị APC gafere n'otu ha Ndị omeiwu gafere PDP gụnyere Dino Melaye, Rabiu Kwankwaso na Usman Nafida. Lee aha ndị sinatọ pụrụ n'APC dịka ụlọọrụ sineeti si depụta ya n'Twitter. Ebe Abdul-aziz Nyako na Monsurat gafere otu ADC. Ọpụpụ ndị a mere ka ndị otu PDP bụrụ pati kacha n'ụlọomeiwu ukwu. Ugbua, ndị omeiwu si PDP dịzị 64 ebe ndị nke APC dị 45. Ka ọ dị ugbua, ndị otu PDP nọ n'ụlọomeiwu na-enwe ọṅụ maka ihe a mere. Ndị hapụrụ APC n'ụloomeiwu nke nta gụnyere Danburam Nuhu, Mark Gbilah, Razak Atunwa, Ahmed Garba Bichi, Abdulsamad Dasuk na Zakari Mohammed. Ndị ọzọ bụ Sani Rano, Barry Mpigi, Ali madaki, Dickson Tackighir nakwa Hassan Saleh. Cheta n'ụtụtụ, anyị wetaara unu akụkọ na ndị EFCC wakporo ma gbochie ụlọ Saraki na osote ya bụ Ike Ekweremadu. Mgbe BBC na Yusuph Olaniyonu bụ ọnụ na-ekwuchitere Saraki kpara n'ekwentị, o kwuru na ọ maghị ebe Saraki nọ, mana e mechara hụ Saraki n'ụlọomeiwu ebe ọ nọ kwuputa ngafe ya na ụfọdụ ndị omeiwu ndị ọzọ. Nke a sotere ọtụtụ ozi BBC zigara ekwenti ha mgbe akụkọ gbasara mkpochi ụzọ a pụtara ihe. Onye enyemaka ya bụ Banks Omishore, tinyere na Twitter na ha ji ụgbọala ha nyachie ya ịpụ n'ezi. Echefula na ndị uweojii kpọrọ Saraki oku ịza ọnụ ya maka etu ohi e zuru n'Offa si metụta ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Unizik: Iwe na-ewe anyị n'ọnwụ nwanne anyị - Ụmụakwụkwọ Aga m agwa Buhari chụpụ Ngige - Oshiomole Dọkịta egbuola nwaanyị otele ukwu gbalaga
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "West Africa", "South Africa", "Ọwụwa anyanwụ Afịrịka", "Bukola Saraki", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44935544
APC ka bụ ndị kachasị n'ụlọomeiwu
Dịka ịwụfe pati na-arị ibe ya elu ugbu a, ndị ụlọomeiwu nta dị 38 asila pati APC gafee PDP na pati ndị ọzọ
2018-07-24T15:03:42Z
Ndị ụlọomeiwu nta 38 hapụrụ APC gafee PDP na pati ndị ọzọ
Ụlọomeiwu nta Nke a bụ mbu ndị ụlọomeiwu nta kwutere okwu ịchupu Onyeisiala Buhari Na-atụfughị oge ọtụtụ ndị ụlọomeiwu Sineti sicha na pati APC gafee PDP, ndị ụlọomeiwu nta ruru mmadụ iri atọ na asatọ si na pati dị iche iche agafeela PDP. Nke a mere dịka ha nụrụ kepukepu na ndị ogbo ha nọ n'ụlọomeiwu sineti gafere n'otu PDP. Oke ọpụpụ a ebutele arụmụka n'etiti ndị pati APC na PDP maka ndị nwe ụlọomeiwu ugbua. Saraki kwuru na Rabiu Kwankwaso, Dino Melaye na ndị ọzọ agafeela PDP Ụlọ nnọchite anya: Ihe mere na Plateau bụ mkpochapụ agbụrụ Ndị gụnyere mmadụ anọ ndị APC gụnyere Olasupun Abiodun, Olubemi Samson na Akintola Taiwo si n'Oyo Steeti baa pati 'African Democratic Party' (ADP). Ndị nke gara pati PDP dị mmadụ iri atọ na anọ gụnyere Sani Ranu, Aliyu Madaki, Dickson Takiu, Shehu Usman, Nasuru Garu, Garba Umar, Olayonu Dokpe, Emmanuel Udendi, Aminu Shehu Shagari, Kabiru Maraba, Abdulsaman Dasuki na ndị ọzọ. Onyeisi ụlọomeiwu nta gụpụtara nke a site n'akwụkwọ ndị a degara ya. Ndi pati APC ji obi ụtọ nabata ndị a batara n'otu dịka ha gosiri ya n'akara twitter ha. Ndị pati APC kwuru na-agbanyeghi nke a mere, na ha kwụ chịm n'ala dịka pati nọ n'ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Saraki kwuru na Rabiu Kwankwaso, Dino Melaye na ndị ọzọ agafeela PDP Ihe mere EFCC ji wakpoo Ekweremadu Saraki na Ekweremadu: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mgbochi ha
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "All Progressives Congress", "PDP (People's Democratic Party)" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44934496
Ndị sineti agbakutela Ekweremadu
Ndị sinetọ mmadụ 108 na ndị isi otu pati PDP nọ n'ụlọ osote onyeisi ha bụ Ike Ekweremadu ugbua iji kwado ya.
2018-07-24T15:11:53Z
Ndị sineti niile agbakutela Ekweremadu
Ekweremadu Onye nkwuchiteọnụ osote onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Uche Anichukwu gwara BBC Igbo na ndị ụlọomeiwu sinetị nọ ugbua na be osote onyeisi sineti bụ Ike Ekweremadu. Anichikwu kwuru na ha gara ikwado ya ma gwaa ya na ha kwụsị ike n'azụ ya. Nke a bụ na agbanyeghi ihe mere n'ụlọomeiwu sineti taa. Nke a na gosikwara na ọ bụghị naanị ndị omeiwu otu pati PDP na-akwado Ekweremadu kama ndị otu pati ndị ọzọkwa gụnyere APC. Saraki na Ekweremadu: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mgbochi ha Ekweremadu 'zoro akụnaụba ya' E tinyela udo Naịjirịa n'aka Ekweremadu ọzọ Ndị omeiwu sineti dị mmadị 109, ọ bụrụ na mmadụ 108 nọ na be Ekweremmadu ugbua, ọ pụtara na ha niile nọ na be ya. Cheta na ụlọomeiwu sineti kpebiri taa ka ndị ọrụ nchekwa pụọ n'ụlọ osote onyeisi sineeti bụ Ike Ekweremadu ozugbo, ebe ha wakporo taa. E gbochiri Ekweremadu ịpụta n'ụlọ ya n'ụtụtụ taa, mere ka ọ ghara ịbịa nzukọ ndị ụlọomeiwu ukwu mere taa, ebe ndị omeiwu ruru 14 hapụrụ APC gafee PDP. Uche Anichukwu bụ ọnụ na-ekwuchitere Ekweremadu, gwara BBC Igbo na ndị EFCC gbochiri ya ịpụ n'ụlọ ya n'Abuja, na ọ bụghị DSS dịka anyị dere mbụ. @MrBanksOmishore bụ onye enyemaka pụrụiche nke Bukola Saraki, depụtara akwụkwọ ozi ndị EFCC ziteere Ekweremadu n'ụtụtụ a, na Twitter. N'ime akwụkwọ ozi ahụ, EFCC kwuru na ha chọrọ inyocha Ekweremadu maka ịkpa nkata, mmerụ ikike ọkwa ya nyere ya na ibupu ego nke Bekee kpọrọ 'money laundering'. Ka Saraki banyere n'ụlọomeiwu ma bido 'plenary', o kwutere okwu na Ekweremdu abịanwughị, ma kwuo na-ekwesịrị ịgba mbọ hụ na ọchịchị onyekwuouche ya emebighị. Omeiwu Sam Anyanwu kwuru na ya na Ekweremadu nọ ụnyaahụ, mana onweteghị akwụkwọ gosiri na ndị uweojii na-achọ ya. Ka e mechara 'plenary', ndị omeiwu kpebiri na ndị ọrụ nchekwa kwesịrị ịpụ n'ụlọ osote onyeisi sineeti bụ Ike Ekweremadu ozugbo, ka o nwee ike rite ikike ruru ya. N'ụtụtụ a, Saraki so na ndị egbochiri ịpụ n'ezi ụlọ ya. N'aka ọzọ, onyeisi ala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kelere ndị siri na APC pụọ taa ka ọ gara ha nke ọma. O kwuru nke a site na akara Twita ya bụ @MBuhari: Ndị EFCC gbochiri ọnụụzọ Ekweremadu n'Abuja Ihe onyoonyo na-egosi ebe ndị EFCC chewere n'ihu ụlọ Ekweremadu:
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-44957021
A maala ndị tọọrọ ma gbuo ụkọchuckwu ụka Katolik ikpe ọnwụ
Ụlọikpe ukwu amaala ndị tọrọ ma gbuo Fada John Adeyi ikpe ọnwụ site na nkwugbu.
2018-07-25T17:50:57Z
A maala ndị tọọrọ ma gbuo ụkọchuckwu ụka Katolik ikpe ọnwụ
Ụdọ Ụlọikpe enyela iwu ka akwụgbu ndị omekome Ndị ụlọikpe ukwu dị na Makurdi, Benue steeti ekpebiela ka a kwụgbuo mmadụ abụọ, Hartuna Idi na Suleiman Gina bụ ndị fọrọ na ndị tọrọ ma gbuo Fada John Adeyi rue oge ha nwụrụ maka ihe ha mere. Cheta na ndị ntọọ mmadụ anọ gụnyere Saidu Abdullahi na Aliyu Garba tọrọ Fada Adeyi, onye Vika-Jenaraalụ ụka Katọlik n'Otukpo Dayosis, Benue steeti, gbuo ya ma tufuo ozu ya n'ime ugbo dị nso na Otukpo n'afọ 2016. Ihe m gabigara n'aka ndị ntọ A gbapụtala nna Mikel Obi n'aka ndị ntọ ọzọkwa Mana e mechara ndị uweojii nwuchie ha anọ, ha kwupụta na ha natara ezinaụlọ ụkọchukwu ahụ otu nde naira na ụma(N1.7m) dịka ego isi ya mana ha gbagburu ya oge ha nụrụ na ndị obodo jikere ịbịa gbapụta ya ebe ha nwụchiri ya. Otu n'ime ha kwupụtara na ọ bụ ya gbara ya egbe gburu ya, ebe a mara mamdụ abụọ fọrọ n'ime ha ikpe ọnwụ taa bụ Wenezde. N'ozi ezinaụlọ ụkọchukwu ahụ zigara ụlọakụkọ Daily Post, ha gosiri afọ ojuju na n'ikpeazụ, ikpenkwụmọtọ erutela ha aka. Mana ha tụrụ arịrị na mkpebi ahụ chetara ha ogbugbu n'ike e gburu Adeyi, onye bụ ọkammụta. Ndị sineti agbakutela Ekweremadu Saraki na Ekweremadu: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mgbochi ha APC na-akwụ ụgwọ ọchịchị nchịgbu ha na-achị - Ọkachamara
[ "Naijiria", "Benue steeti", "Ikpe", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44957245
Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue Steeti awụfela PDP
Ortom ahapụla APC, onye bụbu onyeisi oche pati APGA n'Enugwu ekwuola na nsogbu adịghị n'APGA maka Bianca Ojukwu izọ ọkwa Sineti na akụkọ ndị ọzọ.
2018-07-25T18:36:36Z
Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue Steeti awụfela PDP
Onweghi nsogbu dị n'etiti ndị APGA maka Bianca - Nkolagu Dịka akụkọ kwuru na nkwupụta Bianca Ojukwu na ya ga-azọ ọkwa Sinetọ na Anambra-South n'aha pati APGA ga-ebute nsogbu n'etiti ndị APGA, onye bụbu onyeisi oche APGA n'Enugwu steeti bụ Okechukwu Nkolagu ekwuola na enweghi nsogbu nọ na otu ha. Obiano emeela onye Igala kọmishọna Akụkọ kachasị n'abalị: Akwamozu Joe Achuzia Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue Steeti awụfela PDP Samuel Ortom na ndị uweojii enweela nghọtaghe n'oge garaaga Gọvanọ Benue Steeti bụ Samuel Ortom ahapụla pati APC wụbanye na PDP site n'akwụkwọ ozi onye enyemaka ya bụ Terver Akase zigara ndị ntaakụkọ. Ọteela atụwara anya na Ortom ga-ahapụ APC maka nsogbu dị n'etiti ya APC nke Benue Steeti. Ortom: Ihe m jiri kpụpụ Miyetti Allah ụlọikpe A ga-elikọta ndị nwụrụ na mwakpo Benue Ogbunigwe gbara na Pakistan Onye ogbunigwe mgbagbu onwe egbuola ihe ruru mmadụ iri atọ na otu n'ogige ebe a na-ebinyeaka dị na Quetta na mba Pakistan. Ndị agha nnupuisi Islamic Steeti ekwuola na aka ha dị na ogbunigwe a gbara. N'egwuregwu: Otu Barcelona esila n'azụ ndị AS Roma maburu onye na-agbara otu Bordeaux bọọlụ bụ Malcom n'ọnụ ego dị nde Yuro iri anọ. Akụkọ kwuru na Roma na Bordeaux ekwerịkọta n'ịzụ Malcom tupu Barcelona agbajie ndị Roma aka n'ịzụ ya. Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a Lee ihe nkiri anyị
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Benue steeti", "All Progressives Congress", "Barcelona", "Bọọlụ", "Pakistan", "PDP (People's Democratic Party)" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44958350
O nwere mmụọ bi na nwata bu isi dada pụta ụwa?
Ihe omenala Igbo kwuru gbasara isi dada n'oge gboo na kwa ebumnuche sokwa ya ugbua.
2018-07-26T15:44:42Z
O nwere mmụọ bi na nwata bu isi dada pụta ụwa?
N'oge gboo, Igbo nwere nkwenye na ndị bu isi dada nwere ike ime anwansi Akwa nwata ọhụrụ n'ụlọ ọbụla na-ebute nnukwu ọṅụ n'obi onye ọbula. Mana o nwere ụfọdụ ebe n'ala Igbo ebe nwata ọhụrụ a mụrụ buru isi dada nwere ike ịbute egwu. Ndị obodo a dịka Igbuzo(Ibusa) n'ime Delta steeti , ebe a na-ahụ ụmụaka bu dada dịka ndị pụrụ iche. Onye bụ onye isi dada? Akụkọ ụfọdụ kọwara na nwata a mụrụ ọhụrụ buru isi dada bụ maka na nne ya rịọ otu mmụọ bi n'ala a arịrịọ ka o nye ya nwa. I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo? Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo? Ha nwere nkwenye na isi dada bụ akara ndị mmụọ kara nwata ahụ nke ha ga-eji mara ya. Ha na-akpọ ụmụaka a 'Ezenwa'. Ha nwere nkwenye na isi dada ha bụ okpueze ha. Dịka ka ha siri nwe nkwenye, nwata buru isi dada ga-abụ nwata ga-eme nke ọma n'ụwa maka na chi ya kwụsiri ike n'akụkụ ya, ha na-esi ezigbo ike, nakwa na ha ga-eto buru dike na-ebute nnukwu egwu n'oge agha. Mana ọtụtu nsogbu na-eso ndi bụ isi dada. Ọ na-afịahụ ị lekọta isi dada nke ọma Nsọ sonyere n'isi dada Ọtụtụ n'ime ndị ọbọdọ a, nwere nkwenye na nwata buru isi dada ga-arịa nnukwu ọrịa maọbụ nwụọ ma ọ bụrụ na mbọisi banye na ntụtụ ya. Ọ bụ arụ imetu aka na ntutu onye bu isi dada. Onye ọbụla mere udi ihe a kwesiri inye nwata ahụ ego n'aka ngwa ngwa ma ọ bụ kedo ego ayọrọ n'isi ya. Sọọsọ emume a ga-akwụsị nwata ahụ ịrịa nnukwu ọrịa. Ọ bụ sọọsọ nne nwata ahụ nwere ike ịmetụ ntụtụ nwata a nwere isi dada aka. Emume okpukpe ịkpụ isi dada Akụkọ kwuru na ọ bụ ndị dibia na-akpụ isi nwata buru isi dada. Ugbua ndị ama ama n'ihe onyonyo na kwa ọtụtụ mmadụ ji isi dada eme ịnyanga Nwata ahụ ga-atoola eto, bụrụ nwata na-ekwu okwu. Ezinaụlọ ya ga-ajụ ya ihe ọ chọrọ ka eji nwere kpụ ya isi dada ya. Ihe niile ọ chọrọ n'ụbọchi ahụ ka ha ga-enye ya. Uka Kraist Ala Igbo niile bụ ebe okwukwe ndị otu ụka Kraist kwusiri nke ọma. Ihe a emeela ka ọtụtụ omenaala Igbo gbanwe agbanwe. Ugbua ọtụtụ ndị umụafọ Igbo ekweteghị na ajọ mmụọ bi n'ịme nwata ọbụla buru isi dada pụta n'ụwa. Mana ha ka na-akpọrọ ụdị nwata ahụ gawa ụlọụka ka ndị ụkọchukwu mere ya ekpere. Dọkịta Anthony Mgbolu gwara BBC Igbo na isi dada bụ ihe na-esite na agbụrụ ezinaụlọ ahụ. Ihe omenaala Igbo kọwara maka ndị isi dada Ọkachamara n'ihe ọmụmụ gbasara Afrịka na asụsụ na Mahadum University of Lagos bụ Chiagozie Nnabuihe kọwara BBC Igbo na ala Igbo n'oge gboo enweghị nkwenye ọbụla gbasara ndị bu isi dada. Nnabuihe kwusiri ike na ọ bụrụ na Igbo n'oge gboo nwere nkwenye n'isi dada ha kwesiri inye ya aha. N'ọnụ okwu ya: "Dada bụ aha ndị yoruba nyere ya. Ndị Igbo na-asọ isi dada bụ maka a ha na ndị Yoruba enweela mmekọrịta." Mana isi dada ọ bụ ihe ọjọọ n'ezie? Nnamdi Daniels bụ onye na-eme ihe nkiri Ọtụtụ ndị mmadụ anyị gbara ajụjụ ọnụ kwuru na o nweghị ihe ọjọọ dị n'isi dada mana n'ezi e, ọtụtụ mmadụ ka na-ele ndị bu isi dada dịka ndị na-eme agwaa ọjọọ. Nnamdi Daniels bụ nwoke bu isi dada gwara BBC Igbo na ọ hushiela anya maka mkparị ha na akparị ya maka isi dada ya. N'ọnụ okwu ya: "Echetera'm otu oge m mere njem gawa mahadum nke Niger Steeti. Onye nchekwa bidoro ịgba m ajụjụ gbagwojuru m anya maka isi dada m. Ihe a butere m nnukwu ihere."
[ "Naijiria", "Omenala" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44973633
'Ndị ọchịehi akpaala ike karịa Boko Haram'
Otu a na-akpọ International Crisis Group ekwuola na ndị ọchịehi egbuola mmadụ ugboro isii n'afọ a karịa ndị Boko Haram.
2018-07-26T18:01:12Z
ICG: Ndị ọchịehi akpaala ike ugboro isii karịa Boko Haram
Ndị na-agbapụ Ndị mmadụ buru ngwongwo ha agbapụ n'obodo ha ka ndị ọchịehi gburu ihe ruru mmadụ 200 na Jos Ndekọ ọhụrụ apụtala ebe ndị otu na-ahụ maka ọgbaghara na mbaụwa a na-akpọ 'International Crisi Group (ICG)' na Bekee tiri mkpu na ndị ọchịehi egbuola mmadụ karịa ka Boko Haram gburula. Nke a bụ agbanyeghi na Boko Haram bụ ndị a ma ama na mbaụwa dịka ndị na-eyi egwu, ha achịtaghị aja ebe ndị ọchịehi nọ maka na ndị ọchịehi egbuola karịa ha ugboro isii n'afọ a. N'akwụkwọ ahụ ha bipụtara na webusaịtị ha, ha kwuru na ndị ọchịehi egbuola mmadụ 1,300 kemgbe ọnwa Jenuwarị afọ a. Ha kọwara na kama ogbugbu ndị ọchịehi na-emebu na-akwadoghị akwado, ha na-ejizi anya ọcha kpaa nkata pụrụ iche etu ha si ekpochapụ obodo na ala ndị mmadụ. Gụọnụ ndị ọchịehi ndị oyiegwu -Ụlọomeiwu Ndị ọchịehi awakpola Akure South 'Kwụsị ime ndị ọchịehi ka ụmụnna gị' Akwụkwọ ahụ kwukwara na mbụ ọ na-abụ mkparị na-ebute mwakpo ndị ọchịehi na Benue, Platu, Adamawa, Nasarawa na Taraba steeti, mana ugbua, ọ bụzị nkata a kpara nke ọma imemina mmadụ. Nke a bụ ihe fọdụrụ n'ụlọ ndị mmadụ ndị ọchịehi mebiri na Jos Lee ihe buliri mkpamkpa ndị ọchịehi n'afọ a Agbanyeghị na o teela nsogbu ndị ọchịehi bidoro n'etiti ha na ndị ọrụugbo, nke aafọ a boliri uzu nke ukwuu. Lee ihe ndị ICG kwuru kpatara ya; Mmebi gburugburu na ụdịdị gburugburu mpaghara ugwu Naịjirịa maka aja si na dezat ekpochi ebe ha na-azụ anụ. Nke a mere ndị ọchị ehi ji awakpozi obodo ndị dị na mpaghara etiti Naịjirịa na steeti ndị dị ebe ahụ Gọọmenti egeghi ntị ma ndị obodo kpọọ ha: Ọtụtụ oge ka obodo ndị a wakporo na-ekwu na ha gwara ndị uweojii maọbụ ndị agha na mwakpo na-abịa mana ha anaghị abịa n'oge maọbụ ha bịasịa pụọ, ndị ọchịehi awakpokwa ha. Ndị ICG kwuru na nke a so awunye mmanụ n'ọkụ ya bụ mkpamkpa Gọọmenti anaghị ata ndị na-akpa arụ ahụhụ kwesiri ha: Ha kwuru na ndị gọọmenti na-agbalị mana ha anaghị eji aka ike eso ndị na-eme mwakpo ahụ n'obodo dị icheiche. Nke a nwereike ime ha na-eme ihe chọrọ maka na a naghị ata ha ahụhụ ndị kwesiri ndị mere ụdị arụ ha na-emel Iwu ndị machiri ịchụehi na mbara nke steeti ụfọdụ hibere: Steeti Benue na Taraba hibere iwu ọhụrụ nke na-anaghị ekwe ka mmadụ ọbụla chịa ehi na mbara na gburugburu steeti ahụ. ICG kwuru na iwu ahụ so kpalie ndị ọchịehi ahụ maka na ọ dị ka ọ na-amachi ha ime ihe gbasara ha b.ụ ịchụehi n'ebe ha chọrọ ịchụ ya. Man aka na-achị Benue steeti bụ Samuel Ortom ekwuola ugboro ugboro na o meghi iwu ahụ iji megide mmadụ mana ọ bụ iji kwụsị esemokwu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo nke na-ememina ndụ ndị mmadụ na steeti ahụ. Mịnịsịta na-ahụ maka ọrụ ugbo bụ Audu Ogbeh bụkwa onye Benue steeti ekwukwaala na mwakpo ahụ na-eme na steeti ahụ abụghị maka iwu ahụ. Ebe ụlọ a dị otu a, ajụjụ ga-abụ ma o nwekwara onye si n'ime ya pụta maka na ndị ọchịehi na-eji abalị agba ụlọ ndị mmadụ ọkụ Gịnị ka a ga-eme? Ọ bụghị naanị nsogbu ka akwụkwọ ahụ kwuru maka ya, ha tụtakwara aro etu a ga-esi mezie ihe ahụ ka ọ dị mma. Ha kwuru na gọọmenti etiti Naịjirịa kwesiri ịchekwa ma ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehi ime ka mmadụ niile nwee nchekwube na ha nwere nchekwa tọrọ atọ n'aka gọọmenti Ọzọ dị ka ibe ya bụ ịa ndị niile na-eme mkpaamkpa n'obodo dị icheiche ahụhụ dịrị ha na-ekweghi ka onye ọbụla gbalaa n'efu maọbụ na-ataghị ahụhụ njọ ya Ha kwukwara ka gọọmenti etiti malite mgbanwe banyere ịụ anụ na Naịjirịa ebe ha kwuru ka gọọmenti steei jiri nwayọọ na-ewepụa atụmatụ ịmachị ịchịehi na mbara steeti ha Akwụkwọ ahụ kwukwara mkpa ọ dị ka ndị isi obodo ghara ikwe ka a na-akọ ọnụ maọbụ na-ekwu ajọ okwu megide onye ọbụla kama ka ha kwadoo mkparịtaụka n'etiti ndị obodo ha na ndị ọchịehi nakwa ikwado atụmatụ ga-eweta udo Ndị mba ọzọ nyere Naịjirịa aka ma kwado mgbanwe a ga-eme n'atụmatụ ịzụ anụmanụ na Naịjirịa nke a kpọrọ 'National Livestock Transformation Plan" na Bekee. Mkpamkpa ndị ọchịehi kparala na Benue, Platu na Taraba steeti kamgbe afọ 2018 ka jọ karịa na mgbe mbụ nke mere ọtụtụ mmadụ welitere isi na Naịjirịa ji akatọ onyeisiala Buhari maka na o meghi ihe siri ike iji kwụsịmaọbụ belata mwakpo ahụ. BBC Igbo gbalịrị inweta onye nkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu ka o tinye ọṅụ nokwu mana ọ zaghị. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe ise ị maghị maka 'Yahoo-Yahoo' Akụkọ kachasị n'abalị: Ị hụla ndị ga-anọchite Naịjirịa n'asọmpi iko mbaụwa? Odighị ihe mebiri nụ na APC – Ebubeagu
[ "Naijiria", "Ọgụ ndị na-achịehi", "Ọrụ ugbo", "Ikpe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44963077
Gịnị kpatara ndị Igbo ji agakarị ụlọụka ndị a?
Ụka bụrụ ihe e ji akpa ego n'ala Igbo, ndị Igbo ga-abụcha 'ide ji ego'.
2018-07-29T06:25:58Z
Gịnị kpatara ndị Igbo ji agakarị ụlọụka ndị a?
Ụmụnwaanyị nọ n'ụlọụka Ọ bụ maka na ọ bụ ndị Igbo hibere ụka ndị a ka e nwere ihe ọzọ kpatara ha ji agakarị ha? Tupu ndị ọcha eweta ụka n'ala Igbo, ọtụtụ ndị mmadụ na-efe arụsị maọbụ ikpere 'Chi' ọmenaala nke ụfọdụ na-akpọ "ịgọ mmụọ". Mgbe gboo, oge ụka ka batachara ala Igbo, ndị ụka na-agbakọta n'otu ebe, ebe ha na-anọ aka ụka, pụtara na onye ọbụla na-ama ibe ya, mana ugbua, ọ rara ahụ ịhụ ụdịrị ụka ebe ndị mmadụ ga-ama onye bụ onye, maka na ụlọụka bidoro na-amụbanye nakwa na-ekesa onwe ha gburugburu. Ọtụtụ ndị Igbo ugbua bidoro mepee ụlọụka nke ha, ma nwee igwemmadụ na-abịa aka ụka ebe ahụ, mana ihe a na-ekwu maka ya ugbua bụ ihe ụlọụka ndị Igbo na-aka aga na Naịjirịa. Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo? Ụlọụka agbaala umunne akwụkwọ Mmọnwụ wakporo ụlọụka Katolịk n'Anambara Ọ bụghị ihe e zoro ezo na ndị Igbo anaghị eji ofufe egwu egwu, nke a malitere n'oge ha na-ekpere 'Chi' omenaala, nke bụ na ọtụtụ ndị mmadụ nwere 'Ikenga' nke ha n'ime ezinaụlọ ha. Ịga ụka mere ka ha na-achọkwa ihu Chineke etu ha si mara. Ụka ndị Igbo na-agakarị 1. The Lord's Chosen Charismatic Renewal Ministry: Lazarus Muoka bụ onye hibere ụlọụka a n'ọnwa Disemba 2002. Ọtụtụ mmadụ ọkachasị ndị Igbo, na-aga ya, ma na-eme ihe ndị dị na ya (dịka ị bata Legọs n'igwe ma o nwee emume). Ihe e ji mara ha bụ akwa na-enwuke enwuke, nke ha ji 'egbochi ihe ọjọọ'. Ụfọdụ nwere ike ịkpọ ha ụka ọgbara ọhụrụ. Ha na-akpọ onwe ha 'Chosen army' maọbụ 'Chosen mopol' nke pụara ndị agha a họpụtara ahọpụta n'Igbo. 2. Christian Pentecostal Mission, CPM: Obiora Ezekiel bụ onye hibere ụlọụka a n'afọ 1978. Nke a bụkwa ụlọụka ọzọ ndị Igbo na-agata ọnụ ha. E ji 'Demon Bulldozer' maọbụ 'the Lord's General' mara ya. 3. Catholic: E hibere ụlọụka katọlik nke mbụ na Naịjirịa bido n'oge 1840 gbadatawa, na Kaduna, Legọs nakwa Ọnịcha. Ị jụọ ndị mmadụ, ọtụtụ ga-agwa gị na ọ bụ ndị Igbo kacha ekpe Katọlik na Naịjirịa. E ji "ndị ụka fada" nakwa ikpe 'rosary' maọbụ 'chaplet' nakwa iyi 'scapụla' mara ha. Popu bụ onye na-achịkọta ha na gburugburu ụwa niile, ndị ụkọchukwu ha anaghị alụ nwaanyị. Ị ma na ụlọakwụkwọ katọlik ebe a na-azụ ndị ga-echi fada (seminary) kacha n'ụwa niile dị n'Enugwu? A na-akpọ ya 'Bigard Memorial'. 4. Anglican: Bishop Alex Ibezim bụ Bishọp ndị Angịlịkan na Ọka Dayasis E hibere ụlọụka Anglikan nke ọtụtụ na-akpọ 'CMS' na Badagry dị na Naịjirịa n'afọ 1842. Ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ndị Igbo na-aga ụlọụka a. Ọtụtụ n'ime ha emechaala bụrụ ụkọchụkwu, ma ka na-abụ ya ruo echi. Otu ebe o si dịrị iche na nke ụka katọlik bụ na ndị ụkọchukwu ha na-alụ nwaanyị ma mụọ ụmụ ma ha chọọ. 5. The Redeemed Evangelical Mission (TREM): E hibere ụlọụka a n'ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị, 1981. Onye nwe ya bụ Mike Okonkwo. Ọ gara ọtụtụ ụlọakwụkwọ na-akuzi maka ofufe, ma na Naịjirịa na mba ofesi. Ọtụtụ ndị Igbo na-agakwa ụka a. 6. Watchman Catholic Charismatic Renewal Movement Aloysius Chukwuemeka Ohanebo hibere ụlọụka a n'afọ 2000. E ji izisa ozi maka "ọgwụgwụ oge" mara ya. 7. Ụlọụka ndị ọzọ Ụlọụka ndị ọzọ ndị Igbo na-agakarị bụ Assemblies of God, Grace of God Mission, Living Christ Mission, Presbyterian, Methodist, nakwa ndị nke a na-akpọ nke "ọgbara ọhụrụ" dịka Redeemed Christian Church of God, Living Faith Church nke e ji 'Winners Chapel mara, wdgz. Ihe mere ndị Igbo ji aga ha BBC Igbo jụrụ ndị na-agụ ya ihe kpatara ndị Igbo ji aga ụlọụka ndị a, lee ihe ha kwuru ebe a: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ị ma uru ọjị bara n'ala Igbo? Uru nzu bara n'ala Igbo I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo?
[ "Naijiria", "Ndị otu Kristi", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45000247
Akụkọ kachasị mkpa: Agaghị m atụnyere pati m - Mugabe
Onye bụ bu onyeisiala mba Zimbabwe ekwuola na ọ gaghị akwado otu ya na ntuliaka n'abịa n'ihi na ha rapụtara ya.
2018-07-29T18:39:56Z
Akụkọ kachasị mkpa: 'Ndị ZanuPF rapụtara m' - Mugabe
Akụkọ dị mkpa: Onye bụbu onyeisiala mba Zimbabwe ekwuola na ọ gaghị akwado onye nọchịrị anya ya n'ọkwa ọchịchị bi Emmerson Mnangagwa n'ihi na ọ kwapụrụ ya n'ọkwa ọchịchi. O kwuru na ọ ga-atụnyere ndị ọzọ na ntuliaka a na-akwado ịme na mba Zimbabwe. Ndị uweojii n'Enugu steeti achọrọla nwoke na-ebiputa ego adigboroja gaa n'ụlọ ya dị na Legos ma nwuchie ya. Nwoke a aha bụ Collins Oputa bụ onye Ohaji n'Imo steeti arịọla mgbaghara ma kwuo na ọ bụ ọrụ aka ekwensu butere nke a. Ndịagha Naịjirịa ekwuola ugboro ugboro na ha-emeri Boko Haram Ndị agha Naịjirịa egbuola mmadụ iri na isii so n'otu Boko Haram ma jichie ngwa agha ndị ọzọ na Borno steeti Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị agha kwuru na nke a mere mgbe ndị Boko Haram na-akwado i wakpo obodo Mairari dị na steeti ahụ. N'egwuregwu, Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF ekwuola na ha ga-enye Carl Ikeme ọkwa dịka onye nkuzi oche bọọlụ n'otu Super Eagles. Cheta na Ikeme wụsara bootu ya n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ abalị ole na ole gara aga. Gee Nkeji nke mgbede a Ihe onyonyo nke taa
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Afịrịka", "Zimbabwe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45003089
Gọọmentị ekpochapụọla ọgwụ ụkwara Codiene kariri nde abụọ
Ministri na-ahụ maka ahụ ike ejideela ọgụ ụkwara codien karịrị nde abụọ na kwa na-eleba anya na ndị ọzọ
2018-07-30T14:19:59Z
Gọọmentị ekpochapụọla ọgwụ ụkwara Codiene kariri nde abụọ
Ọgwụ Codiene ụmụ ntorobia na aṅụbiga ogwu codiene oke Gọọmentị etiti ekwuola na ha ekpochapụla ọgwụ ụkwara codiene karịrị nde abụọ n'ime ahịa na Naịjirịa. Minista na-ahụ maka ahụike bụ Okammụta Isaac Adewole kwuru nke a mgbe kọmitee ulọọrụ ya ihebere ịlabaanya na nsogbu Codiene bịara ịgosi ya nchọpụta ha. O kwukwara na nke a bụ maka ị gosi na gọọmentị kwusiri ike na ebumnuche ha imachi ọgụ codiene na Naịjirịa. Mmachi Codeine: Ọgwụ ụkwara adaala ọnụ Nafdac ebuliela mmachi Emzor na ndị ọzọ Adewole kwuru na ụlọọrụ ya na ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ ha kpọrọ National Agency for Food and Drug Administration and Control na Bekee bụ ndị rụkọtara ọrụ na mkpochapụ a. Cheta n'ịme Mee nke afọ a, BBC nwepụtara ihe onyonyo gosiri mkpamkpa ọgwụ ụkwara codiene na-akpa na Naịjiịa. Ọ bụ oge ihe onyonyo a pụtara ka gọọmentị kwuru na ha ga-amachị ọrịre na ọṅunụ ọgwụ ụkwara a. Gọọmentị na-ekwu na ha ka na-elebaanya n'ọgwụ ụkwara ndị ọzọ bụ ọtọ m ogbu m. Akụkọ ga-amasị gị 2019 Election: Lee ụfọdụ ụmụafọ Igbo chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala Gịnị kpatara ndị Igbo ji agakarị ụlọụka ndị a?
[ "Naijiria", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45009558
A kwụsịla ndị omeiwu APC na Benue ọrụ n'ike
Ụfọdụ ndị omeiwu APC na Benue steeti wakporo ụlọomeiwu ha taa dee akwụkwọ nchutu n'ọrụ nye gọvanọ ha bụ Samuel Ortom.
2018-07-30T16:33:22Z
A kwụsịla ndị omeiwu APC na Benue ọrụ n'ike
Ndị omeiwu nọ n'otu pati PDP na Benue steeti akwụsịla ndị otu ha mmadụ asaa nọ APC ọrụ n'ike. Ndị omeiwu PDP ahụ ruru mmadụ iri na itoolu na-akwụsị ndị otu ha ọrụ maka ime omume megide ụlọikpe na ime ọgbakọ megidere iwu. Ndị PDP ahụ kwuru na ọgbakọ ndị APC mere megidere iwu maka na ha erubeghi isi nye mkpebi ụlọikpe nyere ka ha ghara ịga onye bụbụ onyeisi ha bụ Terkimbi Ikyange nso. Ndị Benue apụtaghị nabata Buhari Ortom: Ihe m jiri kpụpụ Miyetti Allah ụlọikpe Ọchị ehi na Benue: 'Aga m emezu iyi ọrụ m' - Buhari Ndị omeiwu PDP ahụ kpọkwara ndị otu mbaụwa ka gbata ọsọ enyemaka na nsogbu dị n'ụlọomeiwu Benue steeti ugbua. Ndị omeiwu APC mere ọgbakọ taa ebe ha tiri iwu ka a chụtuo gọvanọ steeti ahụ bụ Samuel Ortom maka ebubo na o mefuru ego steeti n'ụzọ na-ekwesighi ekwesi. N'ụtụtụ taa, ndị uweojii wakporo ụlọomewiu steeti ahụ na-ekweghi ka ndị omeiwu PDP mmadụ 22 banye. Mana ndị otu pati PDP anabataghị nke a nke ọma ebe ha nọ n'akara ha na twitter na-eti mkpu maka ya bụ ihe ha kpọrọ mmerụaka. Cheta na ụlọikpe nyere iwu n'izu gara aga ịkwụsị onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Terkimbi Ikyange ka ọ ghara ịkpọzi onwe ya onyeisi ha. Iwu ahụ metụtakwara osote onyeisi ahụ bụ James Okefe Ejembi na onye bụbu onye ndu ndị ka n'ọnụọgụgụ bụ Benjamin Tilley Adanyi. Ọkaikpe steeti ahụ bụ Adam Onum kwuru ka ikpe ahụ digide rue oge a ga-ekpebi ikpe ndị ụlọomeiwu ahụ mmadụ asatọ gbara n'ụlọikpe. Akụkọ ga-amasị gị Anwụchiela 'ụkọchukwu' chọrọ ịkpọlite ozu nwụrụ anwụ Ụmụ Naịjirịa tọrọ na Rọshịa abatala Naịjirịa Ndị agha 1000 awụchiela na Zamfara steeti
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Benue steeti", "All Progressives Congress", "Ntọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa", "PDP (People's Democratic Party)" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45013768
Akụkọ ndị dị mkpa
Ndị omeiwu APC na Benue steeti chọrọ ịchutu Ortom ebe akụkọ na-apụ kepu kepu na a chutuola Madumere n'Imo.
2018-07-30T19:53:15Z
Benue na Imo steeti ọ n'izu ichutu ndị ọrụ ha
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Akụkọ na-efegharị ụgbua bụ na mmadu iri na itoolu ndị ụlọomeiwu Imo steeti achụtuola osote gọvanọ Imo steeti bụ Eze Madumere. BBC Igbo gbara onye ndụ ndị ụlọomeiwu Imo Steeti bụ Lugard Osuji ajụjụọnụ, o kwuru na Onye nọchiri anya ya bụ Calistus Okenze bụ onyeisiọrụ n'Imo Steeti dịka Rochas zigara aha ya. O kwuru na mmadụ iri na itoolu n'ime mmadụ iri atọ na asaa ndị ụlọomeiwu tinyere aka chụtuo ya. Okenze anọchiela Madumere n'Imo Steeti - Osuji Naịjirịa Ndị omeiwu nọ n'otu pati PDP na Benue steeti akwụsịla ndị otu ha mmadụ asaa nọ APC ọrụ n'ike. Samuel Ortom: Otu Miyetti Allah bụ ndịkpatara oke ogbugbu mmadụ na Benue Ndị omeiwu PDP ahụ ruru mmadụ iri na itoolu na-akwụsị ndị otu ha ọrụ maka ime omume megide ụlọikpe na ime ọgbakọ megidere iwu. Ndị PDP ahụ kwuru na ọgbakọ ndị APC mere megidere iwu maka na ha erubeghi isi nye mkpebi ụlọikpe nyere ka ha ghara ịga onye bụbụ onyeisi ha bụ Terkimbi Ikyange nso. A kwụsịla ndị omeiwu APC na Benue ọrụ n'ike Akụkọ mba ofesi Igwe mmadụ pụtara na Zimbabwe ịtụ vootu na ntuliaka mbụ ha na-eme kamgbe Mugabe pụrụ n'ọkwa ọchịchị. Ndị si mba ọzọ bịara ileta ya bụ ntuliaka toro ya na ọ na-aga nkeọma ebe ha na-enwe olileanya na ọ ga-anapụta ndị Zimbabwe n'ọnọdụ ha nọ. N'egwuregwu, N'egwuregwu, mba Kameroon na onye na-akụziburu otu egwu bọọlụ mba Ịnglandị bụ Sven Goran Eriksson na-akpa ka Eriksson kuziwe otu egwuregwu bọọlụ ha bụ Indomitable Lions. Sven Goran Eriksson Ihe niile gaa nke ọma, ị mara na ọ ga-anọchi anya onye nkuzi ha pụrụ apụ bụ Hugo Broos. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa:
[ "Cameroon", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Benue steeti", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Bọọlụ", "Imo steeti", "Zimbabwe" ]
https://www.bbc.com/igbo/45022718
Bukola Saraki agbajọọla ndị APC
Onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki ekwupụtala na ya apụọla na pati APC.
2018-07-31T17:50:51Z
Bukola Saraki agbajọọla ndị APC
Saraki chịrị afọ asatọ dịka onye Gọvanọ kwara Steeti Saraki chịrị afọ asatọ dịka onye Gọvanọ kwara Steeti Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki agbajọọla ndị APC. Saraki kwuru nke a n'akara Twitter ya na nkeji ole na ole gara aga. Saraki ekwughị pati ebe ọ na-aba mana o kwuru na ya apụọla. Mana gọọmenti etiti ekwuola na ha amaghị na onyeisi ụlọomeiwu sineti apụọla na pati APC. Onye nkwuchiteọnụ gọọmenti etiti bụkwa mịnịsta ọrụ mgbasaozi dị n'aka bụ Lai Mohammed gwara BBC na a gwabeghi ha na Saraki apụọla na pati APC. APC ka bụ ndị kachasị n'ụlọomeiwu Ihe APC mere PDP ọ ga-eme ha na 2019? Ọpụpụ ndị omeiwu: 'Anyị kwụ chịm' - APC Onye nkwuchiteọnụ APC na Legos bụ Joe Igbokwe kwuru na ọ bụ ndị mgba okpuru na-apụ na pati ahụ. N'okwu ya, "APC abụghị PDP, Buhari abụghị Jonathan, ọpụpụ ha enweghi ihe ọ ga-eme APC." Mana n'elu soshal media, ụmụ Naịjirịa na-etu o si emetụta ha. Tell the Mayor kwuru na ma ụmụ Naịjirịa ekwesiri ibe akwa ka ọ bụ ịchị ọchị gbasara ya, na ọpụpụ ya abụghị maka ụkpụrụ ọma ọ chọrọ igosi maọbụ maka ọganihu ndị mmadụ kama ọ bụ nhazi ọ na-eme maka onwe ya. Abraham Itebu kwuru na o si PDP gaa APC na 2014 sikwa APC gaa PDP na 2018 na-ekwu na ha ji ụmụ Naịjirịa eti epele nakwa azụmahịa onwe ha. Olusanjo Ewulomi kwuru na o kwesiri ị hapụ oche ya maka na pati na-akarịghị n'ọnụọgụgụ enweghi ike ịnwe oche ahụ. Onye omeiwu ibe ya bụ Ben Murray Bruce kwuru na ya ji aṅụrị anabata Saraki na pati ha bụ PDP mana Saraka ekwughikwa na ya na-aga na PDP. Otu pati PDP dekwara n'akara twitter na onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki na-alọghachi na PDP. Cheta n'izu gara aga, ndị ụlọomeiwu mmadụ 15 nọbu pati APC wufere pati PDP ebe ndị nnọchiteanya mmadụ 38 bụbu ndị APC wufekwara PDP na pati ndị ọzọ. Akụkọ ga amasị gị: Onyeisiala Naịjirịa dị Igbo nso karịa 'restructuring'- Osita Okechukwu 2019 Election: Lee ụfọdụ ụmụafọ Igbo chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala Okenze anọchiela Madumere n'Imo Steeti - Osuji
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "All Progressives Congress", "Bukola Saraki", "PDP (People's Democratic Party)" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45038940
Akụkọ kachasị na mgbede a: Ọchịchị abaala APC isi - Ohaneze
Ohaneze Ndigbo akatọọla njide EFCC jidere Ekweremadu sị na ọchịchị abaala APC isi.
2018-08-01T18:29:16Z
Akụkọ kachasị na mgbede a: Ọchịchị abaala APC isi - Ohaneze
Ike Ekweremmadụ Akpụkụrụ Ekweremadu ụlọikpe na o kwucheghị ka ọha mgbe ọ banyere ọchịchị Ohananeze Ndịgbo akatọla njide gọọmenti jidere osote onyeisi Sineti bụ Ike Ekeremadụ. Ode akwụkwọ mgbasa zi otu a bụ Uche Achi-Okpaga sị na ha bụ ijiji aghọrọla isi membi dịka ọchịchị sịrị baa gọọment APC n'isi. Okporo gas ga aga n'Abia steeti Shell na-emepụta 39% mmanu agbidi na Naịjirịa Ndị ọrụ shell nke Naịjịrịa ekwuputela ebumnobi ha ịrụ okporo mmanụ gas n'ebe ụfọdụ n'Abịa steeti. Onyeisi ụlọọrụ a bụ Ed Ubong kwuru na a ga-arụ ụzọụgbọ ga-agafe Osisoma, Ogbo Hill nakwa Ariaria maka nke a. O kwuru nke a mgbe ọ gara ịhụ gọvanọr steeti ahụ bụ Okezie Ikpeazu. Otu BBOG enwetala nkatọ BBOG na-akwanye gọmenti ọkụ ka ha chọta ụmụ akwụkwọ Chibok kemgbe 2014 Otu Coalition Against Terrorism and Extremism akatọla okwu ndị isi na-akwanye gọọment ọkụ ka ha kpọchite ụmụnwaanyị Chibok furu efu bụ Oby Ezekwesili na Aisha Yesufu. Akụkọ kọrọ n'Ezekwesili na Yusufu boro ndị agha Naịjirịa na ha na-eli ndị otu ha ndị Boko Haram gburu na nzuzo. Ntuliaka Zimbabwe Akwụkwọ na-egosi na Zanu-PF na-emeri nduliaka Zimbabwe Ọgụ adaalanụ na ntuliaka ndọrọndọrọ ọchịchị Zimbabwe ka otu pati MDC Allaince na-ebo pati Zanu-PF ebubo ịme nrụrụaka. Ka ọ dị ugbua, otu onye nọ n'ọzụ maka nke a. N'egwuruegwu, ndị AAC tọrọ na Legọs African Athletic Championship bidoro na Asaba tata N'egwuruegwu, ndị egwuruegwu na a ga-asọmpi African Championship tọrọ na ọdọụgbọelụ Lagọs eruola Asaba n'ụtụtụ tata. Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a Lee ihe nkiri anyị
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ahịa mmanụ agbịdị", "Afịrịka", "Zimbabwe" ]
https://www.bbc.com/igbo/45041770
Ihe mere Igbo ji achụpụ mmadụ n'ajọ ọhịa
Ajọ ọhịa bụ ebe Igbo na-efe ala mana ọ bụ mmegbu ka ha na-emegbu ndị ha sụpụ n'ọhịa a?
2018-08-02T12:43:52Z
Ihe mere Igbo ji achụpụ mmadụ n'ajọ ọhịa
Ndị mmanwụ Igbo na-efe mmụọ dị iche iche Gịnị mere Igbo jiri kpọ ajọ ọhịa ajọ ọhịa? Ị mara na ajọ ọhịa ka nọrọ ruo ugbua n'ala Igbo? Gịnị bụ ajọ ọhịa? Ọkachamara n'ihe ọmụmụ gbasara Afrịka na asụsụ na Mahadum nke Lagos bụ Chiagozie Nnabuihe kọwara BBC Igbo na Igbo kporọ ebe a ọhịa mmụọ, ọbụghị ajọ ọhịa dịka ọtụtụ mmadụ na-akpọ ya ugbua. Dịka Igbo siri were nkwenye, ọhịa mmụọ bụ ebe ha na-efe chi biri n'Ala. Ebe a burukwa ebe ha na-asụpụ onyeọbụla Ala bụrụ ọnụ. Ala N'ala Igbo Chukwu kachasị mkpa, mana mmụọ na-eso ya bụ Ala. Nnabuihe kọwara na ala Igbo were nkwenye na Ala bụ mmụọ mụpụtara ihe nịịle dị n'ụwa. O nwere mmụọ bi na nwata bu isi dada pụta ụwa? I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo? Ala sọ njọ (njọ Ala bụ igbuọchụ) Igbo were nkwenye na Ala, na-ahụ ihe niile, nke a pụtara na onweghi njọ ọbụla ị ga-ekpuchi n'anya ya. Ajọ Ọhịa ka dị na-ala Igbo ruo ugbua Ala ga-akụ onye a ọrịa kpam kpam. Lee ọrịa Ala na-akụ ndị mere ya njọ Ara Ekpenta (Leprosy) Afọ ọzịza Nzịza (Dropsy) Ibi(hernia) Nnabuihe kọwara n'oge ahụ, o nweghị dibịa ga-anwa anwa ịgwọ ọrịa ndị a anyị kpọrọ aha. Onye ọbụla were ụdị ọrịa kwesiri ikwupụta njọọ o mere kpamkpam tupu ọ nwụọ. Ọ bụrụ na ọ saghị asịsa njọ o mere, ha ga-asụpụ ya n'ọhịa mmụọ. Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo? Ihe ndị ị na-ekwesịghị ime n'akụkụ onye Igbo Ihe ndị ọzọ dịka ịkwa iko di maọbụ nwunye onye ọzọ, maọbụ ịmụ ejime nakwa ọrịa agwọta agwọta nwere ike imee ka Ala bụọ onye ahụ ọnụ. Nsụpụ mmadụ abụghị njọ Dịka Nnabụihe jiri kọwa, nsụpụ onye a bụ maka ịzọ isi ụmụ ya nakwa ezinaụlọ ya. Ụka Krist bụ okwukwe kachasị n'ala Igbo Igbo n'oge gboo nwere nkwenye na onye ọbụla nabatara onye a anabataala iwe Ala n'ezinaụlọ ya. Ebe ka ọhịa mmụọ di n'ala Igbo ugbua Mkpa Mbaise n'Imo steeti Ogwugwu ọkụ n'ime Okija Mbitoolu ala ogbaga Ihiala Arusi Ọkịja Omenala Igbo na-anwụ anwụ Nnabuihe kwuru na ihe a bụ nke kachasị njọ na-eme ugbua n'ala Igbo. O kwuru na: "Omenaala dị iche iche n'ala Igbo n'anwụ maka ụka Kraist batara n'ala Igbo, ndị mmadụ emetọọla ọtụtụ ọhịa mmụọ a, o nweghị onye na-atuzi egwu ọhịa a" Akụkọ ga-amasị gị A na-ahụ otele nwaanyị a n'ọkụ na Twitter maka ihe o kwuru Ndị ndọrọndọrọ agba ọhụrụ jị soshal midia anya isi
[ "Naijiria", "Omenala", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45051736
Akụkọ kachasị na mgbede a: Idemmiri emebiala ụzọ Igbo
Ndị ọnụ na-erụ n'okwu agala ebe idemmiri na-enye nsogbu n'Anambara steeti ka ha were anya ha hụ.
2018-08-02T19:52:42Z
Akụkọ kachasị na mgbede a: Idemmiri emebiala ụzọ Igbo
Ide mmiri Okporo ụzọ MCC, Urata n'ime Owere Ndị Mịnịstri na-ahụ maka gburugburu n'Anambara steeti, otu ndị gbatagbata gọọmenti etiti (NEMA) na nke steeti (SEMA) gara njem nleta n'Awka, Onicha na ebe ndị ọzọ ide mmiri mebiri ụzọ na steeti ahụ. Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu bụ Michael Okonkwo gwara ndị ntaakụkọ nke a mgbe ha gara ileta mkpamkpa ide mmiri kpara n' Ezi Mgbemena nke dị na Ọnịcha. Ndị gbaara ọsọ pati enwela nzuko mbu Ọtụtụ ndị APC agbafela PDP Ndị isi ọchịchị ụlọomeiwu nakwa nke steeti si pati APC wụfee PDP agaala ọgbakọ ndị isi ọchịchị PDP nke mbụ ha kemgbe ha wụfere. Ndị ọchịchị a gụnyere Bukola Saraki, Rabiu Kwankwaso, Aminu Tambuwal, Samuel Ortom nakwa ndị ọzọ. Popu si onye egbula ibe ya ọzọ Popu Fransis wetere ọtụtụ mgbanwe na ụka katọlik Pope Francis bụ onyeisi ụka Katọlik n'ụwa niile agbanwela nkuzi ndị ụka ahụ ka o megide kpamkpam atụmatụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ agbanyeghị ihe ọbụla onye ahụ mere. O kwuru na ụka Kraịst niile ga-agba mbọ ịhụ na akachapụrụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ na mbaụwa niile. N'egwuruegwu,NFF ekwetala ka ha na Giwa kpee udo Ọchịchị Amaju Pinnick dịka onyeisi NFF ga-abịa n'isi njedebe na Sept. 30 N'iji gboo nsogbu dị n'etiti ha, otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF adịla njikere ibuli mmachi amachiri onye otu ha bụ Chris Giwa. Ha kwuru na nke a ga-adị ire ma ọ bụrụ na Giwa gbahapụ mkpọpụ ọkpọpụrụ NFF n'ụlọikpe. Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a Lee ihe nkiri anyị
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Pope Francis", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "West Africa" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45058141
Ahmed Musa efeerela Leicester City aka
O teela aka a na-anụ kepu kepu na Musa nwere ike ịgafe n'otu Al Nasr mana ugbua, ekwuputala ya.
2018-08-03T10:44:56Z
Ahmed Musa: Otu Al Nasr anabatala ya taa
Ahmed Musa Ahmed Musa Otu onye ndị mmadụ chere na ọ ga-abanye otu egwuregwu bọọlụ gbalitere n'ọkwa bụ Ahmed Musa. Mana ugbua, Musa kpara mkpamkpa n'asọmpi Iko Mbaụwa gwụrụ agwụ esila n'otu Leicester City gafee n'otu Al Nasr nke Saudi Arebia. Amabeghị ego ole ha jiri zụọ ya n'aka ndị Leicester City mana a na-anụ kepu kepu na o ruru nde pounds iri na asaa na ọkara. Ị ma ụmụnwaanyị ji ndị Super Eagles n'ọrụ? Ndị Super Eagles dịzị ka nwunye ọhụrụ a chọrọ ịlụ World Cup 2018: Ihe mere ndị Naịjirịa ji ekele Ahmed Musa Leicester City zụrụ ya mbụ n'aka otu CSKA Moscow n'afọ 2016 mana ọ laghachịrị ebe ahụ n'oge bọọlụ nke afọ 2017 gara aga. Ka agbachara Iko Mbaụwa, ndị mmadu chere na ọ ga-aga Galatasaray maka na ndị na-akwado otu egwuregwu ahụ kpọrọ ya oku nke ukwuu. Ihe onyonyo dị n'elu na-egosi etu otu ọhụrụ ya siri sị ya "nnọọ" ma nabata ya n'ime otu ha. Ka ọ dị ugbua, Ahmed Musa ekwubeghi ihe ọbụla maka okwu a na-ewu ewu.
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45055451
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nkata ịchụda Saraki
Ndị kwadoro APC na PDP na-ama aka mgba maka ọchịchị Saraki dịka onyeisi ụlọomeiwu ukwu.
2018-08-03T13:44:47Z
Saraki: Ndị na-akwado APC na PDP etinyeela ọnụ na nsogbu a
Bukola Saraki Saraki meriri EFCC n'ụlọikpe kachasị n'ọnwa Juli maka ebubo mpu na nruru aka Akụkọ nke mere ọhụrụ n'etiti ndọrọndọro ọchịchị Naijiria ụnyaahụ bụ na otu Peoples Democratic Party (PDP) ahọpụtala onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki dịka onyeisi ha. Mana ụnyaahụ, akụkọ kwuru na PDP ziri ozi ka ndị omeiwu ha niile laghachite Abuja, maka ha na-eche na APC nwere ike ijiri ike mepe ụlọomeiwu wee chutuo Saraki na Ekweremadu. BBC Igbo gbara ndị otu APC na PDC ajụjụọnụ maka ebumnuche ha gbasara ihe a na-eme ugbua n'ọkwa ọchịchị n'ala Naịjirịa. Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuchiri otu APC na Legos steeti gwara onye ntaakụkọ anyị na nsogbu PDP bụ na obi na-amapụ ha maka njọ niile ha mere n'ala Naịjirịa. Saraki na Ekweremadu: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mgbochi ha Saraki: Ụlọikpe kachasị agọọlara m ọnụ N'ọnụ okwu ya,"Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari abụghị onye na-eji njọ akwụghachị njọ. PDP na-ama jiji maka na obi ha na-apịa ha ụtarị maka mpu na aghụghọ niile mere n'oge ọchichị ha." Igbokwe kwusiri ike na ọ bụ ikike ndị Sineit ịhọpụta ndị ha chọrọ ka ha chịa ha. "Ọ bụrụ na ha chọrọ ịchụda Bukola Saraki, o nweghị njọ dị na ya." Mana Austin Umehi bụ otu n'ime ndị welitere isi na PDP kwuru na APC agaghị anwa anwa ịchụda Bukola Saraki. PDP na-ebo na aka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nọrọ na nsogbu a O kwuru na: "Ụlọomeiwu nwere iwu ha na-eso. Ihe a pụtara na ndị otu APC agaghị eteta n'ụra otu ụbọchị, chụda mmadụ dịka Bukola Saraki." O kwukwara na o nweghị egwu dị n'obi Saraki maka ya, nakwa na ndị ụlọomeiwu na-eche echiche a na-egbu oge ha. Etu ọ dị ugbua PDP sị na Saraki bụ onye otu ha kachasị elu n'ọkwa ọchịchị n'ala Naịjirịa, nke mere ha jiri tunye ya ugo a. Dịka o siri dị ugbua, nke ga-abụ mbụ pati na anọghị n'ọchịchị, maọbụ nwekarịa ndị omeiwu, ga-achi ụlọomeiwu na Naịjirịa. Mana, a mabeghị ma ọnọdụ a ọ ka ga-adị etu a, maka na n'ụbọchị 24 nke ọnwa APC wepụtara aha ndị omeiwu 52 ha si bụ ndi otu ha, nke nyere ha nkarị n'ụlọomeiwu. Ya bụrụ na nke a bụ eziokwu (o nwebeghị ndị n'ime ndị a gọnahụru edemede a) APC nwere ọnụgụgụ a ga-eji chụtuo Saraki ma ndị omeiwu laghachite ezumike. Ekweremadu ka-aza ajụjụ n'aka ndị EFCC Nke mekwara ụfọdụ ndị omeiwu nke obele jiri nọdụ n'ụlọomeiwu ụnyaahụ. Akụkọ kwukwara na ndị sinetọ otu PDP ga-enwe ọgbakọ ebe ha ga-eche ihe a ga-eme ma ọbụrụ na APC mere udi ihe a. Ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ Sun dere na ndị Sinetọ gara njem n'ala Bekee ga-alaghachị azụ taa maọbụ echi. Chukwuka Onyema bụ osote onyeisi otu PDP n'ụlọ omeiwu obele gwara ndị ntaakụkọ na ha nụrụ akụkọ ndị sinetọ otu APC ga-emee ọgbakọ na nzuzo ịchụda Bukola Saraki. PDP na-ebokwa na njem Buhari gara ala Briten bu maka inyere ndị sinetọ APC ohere ịchụda Bukola Saraki. Asị, asị! Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjịria bụ Garba Shehu bụ na-ebubo nke a gbasara Buhari bụ asị na-atọ ọchị maka na o nweghị onye ọbụla na Naịjirịa ga-ekwenye n'ihe ọbụla PDP ga-ekwu ọzọ n'ala a. Akukọ ga-amasi gị Ihe mere Igbo na-asụpụ mmadụ n'ajọ ọhịa Saraki: Ụlọikpe kachasị agọọlara m ọnụ
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45068260
Mmepụta ọkụ latrik arịala
Yabụrụ na ihe Babatunde Fashola kwuru maka mmepụta ọkụ latrik bu eziokwu, ọ ga-abụ nnukwu ihe nye ndị ojiegochụego na Naịjirịa.
2018-08-04T07:28:46Z
Babatunde Fashola sị na Naịjirịa na ayọrịbazi egwu maka ọkụ latrik
Ọdụ anụ Otela ndị Naịjirịa na-eti mkpụ maka ọkụ adịghị Minista na-ahụ maka ọkụ, ọrụ na ụlọ bụ Babatunde Fashola kwuru na ọkụ latrik a na-emepụta na Naịjirịa agbagotela ruo megawatt puku asaa. Fashola kwuru nke a na Kalaba, isi obodo Kros Riva steeti ụnyaahụ. Ọkụ latrik agaghị enwu ọfụma ruo afọ 2023 - Ndị ọrụ latrịk PHCN kwesịrị inye gị ọnwa atọ tupu ha achabie ọkụ - Ọkaiwu Fashola nọ na Kalaba ebe ndị isi ọrụ na ngalaba ọ na-achị na-eme nzukọ. O kwuru na agbanyeghi na ọrụ fọdụrụ ka nkụ, ngalaba ya agbanyela ọnọdụ ọkụ latrik na Naịjirịa karịa etu ọ dị mgbe ha malitere ọru n'afọ 2015. Fashola jị ngalaba atọ achịkọtara ọnụ na gọọmentị Buhari "Afọ ato gara aga, akukọ bụ na mmepụta ọkụ latrik bụ nnukwu nsogbu anyị nwere na Naijirịa. Mgbe ahụ, ndị na-eke ọkụ na-ekwu na ha enweghị nke ha ga-ekenye ụmụ Naịjirịa. "Mgbe ahụ, anyị na-eke "megawatt" 2,690 nye ndị Naịjirịa, mana akụkọ ahụ agbanwela. Ihe anyị nwere ike ugbua bụ megawat 5,222, nke bụ nke kachasị kamgbe Naịjirịa pụtara. "Ugbua, ihe a na-emepụta bụ megawatt 7000, ma na-ekekwa 7000. Nsogbu ka dịkwa, mana anyi ga-ekwu na anyị na-aga n'ihu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 'Nye nwa gị ohere ka ọ mịta ara' Ndị Igbo na-azọ eze na Kano A gbagbuola ndị na-agbanwe ego mmadụ anọ na Port Harcourt
[ "Naijiria", "Ike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45058142
Ihe gị na ụmụ gị nwere ike ịme n'oge ezumike
Ma iji ego ma ijighi ego, lee ihe ụfọdụ gị na ụmụ gị nwere ike ime n'oge ogologo ezumike a.
2018-08-05T11:27:54Z
Ụzọ ị ga-eji mee ụmụaka gị obi aṅụrị n'oge ezumike
Ụmụakwụkwọ na Oprah Winfrey Oge eruola ọzọ mgbe ndị ụmụakwụkwọ nwere oge ezumike pụrụiche maka na ọ dị ogologo. Ụfọdụ ndị nne na nna akwadola etu ha ga-esi kpọga ụmụ ha ụlọakwụkwọ nke a kpọrọ 'Summer Lesson' mana ọ bụghị ụmụaka niile ka nke a ga-amasị. Ọ bụrụ na ị sonyeghi na ndị ga-akpọga ụmụ ha 'Summer Lesson', lee ihe ndị i nwereike i mere ha. Ụmụ nwaanyị chọrọ ka gọọmenti kwụwa ha ego ọmụgwọ Akpokpụtala ụmụaka 4 n'ime 12 bụ ndị tọrọ n'ime ọgba Thailand Buhari: Buo agha megide mwakpo ụmụaka Kuziere ha etu e si egwu mmiri Igwu mmmiri bụ ụzọ ụmụ gị ga-eji megharịa ahụ ma mụta ị zọ onwe ha ma ha danye n'ime mmiri. Ọ ga-emekwa ha ka ike gwụ ha ọfụma ka ha nweike rahụ ụra ọfụma ma too ọfụma. Gbalia kpọga ha taa. Kuziere ha eserese nakwa nka na ụzụ ndị ọzọ Kuziere ha etu esi agba egwu Igbo kwenu! O nwere egwu karịrị egwu ogene? Mba! Anyị a ga-akụziri ụmụ anyị ya? Eeeeeee Kọrọ ha akụkọ oge gboo Ị ma ụbọchị mbụ atụrụ ogbunigwe n'ala Igbo? Ị ma aha nwoke mbụ si n'oru tọghapụ onwe ya? Ị nwere ike ị maata nke a ma kuzikwara ụmụ gị. Otu ụzọ ị ga-esi mee nke a bụ ị kpọrọ ha gaa n'ụlọ ngosi dị ịcheịche n'ala Igbo. Aka-ọrụ Kpọrọ ha gaa ebe ha ga-amụta ọrụ aka. Nke a ga-eme ha mụta aka ọrụ nwere ike ị nye ha nri n'ọdịnihu maọbụrụ na ha enwetaghị ọrụ na ngwụcha mahadụm. Otu Ọgbọ Na ngwụcha, ọ bụrụ na ị bụ onye omenala na-amasị nke ọma, oge ezumike ogologo a bụ mgbe i nwere ike iji tinye ha na mmanwụ maọbụ otu ọgbọ n'obodo unu. Nke a ga-eme ka ha nwee ezigbo amamihe, akọ na uche banyere omenala Igbo nakwa n'ebe o siri ike. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 'Nye nwa gị ohere ka ọ mịta ara' Ihe mere Igbo ji asụpụ mmadụ n'ajọ ọhịa
[ "Ezinụlọ", "Naijiria", "Ụmụaka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45076820
Ndi agha Naịjirịa etiela ndị ọchịehi mmanwụ na Benue
Isi ulọọrụ ndị agha Naịjirịa kwuru na ha meriri ndị ọchịehi ahụ n'agha egbe ha abụọ kwatara ebe ha gbagburu ụfọdụ, ụfọdụ agbalaga.
2018-08-05T13:17:49Z
Ndi agha Naịjirịa zutere ndị ọchịehi na Benue tie ha mmanwụ
Ndị agha Naịjirịa Ndị agha Naịjirịa ekwuola taa na ha zutere ụfọdụ ndị ọchịehi ji ọtụtụ ngwọagha n'okpuru ọchịchị Guma na Benue steet. Ndi agha ahụ kwuru na ndị agha nọ agha a kpọrọ "Operation Whirl Stroke" na Bekee bụ ndị zutere ndị ọchịehi ahụ kpo ọtụtụ ehi nakwa ọtụtụ ngwọagha. Ha dere n'akara twitter ha na ndị agha mekpara ha ahụ site na ngwọagha ka nke nke ha. Ha kwuru na ndị ha agaghị agụtali ọnụ bụ ndị a na-atụ anya na ha gburu ebe ndị ọzọ wụbara n'ime ọhịa mana ha bu mgbọ egbe n'ahụ. Gụọnụ ndị ọchịehi ndị oyiegwu -Ụlọomeiwu Plateau: Ndị ọchịehi egbuola mmadụ 25 Ọtụtụ mmadụ agbaala ọsọndụ na Kogi Ha kwukwara na ha na-agba mbọ inweta ndị ahụ gbara ọsọ mana ha natara ọtụtụ ngwọagha n'aka ndị ha gburu. Ha kpọkwara oku ka onye ọbụla hụrụ ihe na-ekwesighi ekwesi maọbụ onye ọbụla bụ mgbọ egbe n'ahụ gaa kpee n'aka ndị ọrụ nchekwa nọ ha nso. BBC Igbo gbara mbọ ịnweta onye nkwuchiteọnụ ndị agha mana ha azaghị. Cheta na ndị ọchịehi awakpola ma gbuo ihe karịrị mmadụ otu puku na Benue, Taraba na Platu steeti n'afọ a 2018. Agha a kpọrọ 'Operationa Whirl Stroke" na Bekee bụ nke ndị agha ji aluso ndị ọchịehi ọgụ na steeti anọ ndị ọchịehi na-akpa ike. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Lee nri 10 ndị ogbenye ọgaranya na-erizi Mahadum Covenant dara iwu - ọkaiwu Gịnị butere mkpamkpa n'eme na Kogi?
[ "Naijiria", "Plateau steeti", "Benue steeti", "Ọgụ ndị na-achịehi", "Ntọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa", "Taraba steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/45076822
Akụkọ dị mkpa taa
Akụkọ na-ekwu na Hafiz Abubakara tinyere akụkwọ ahụ tupu a chutuo ya
2018-08-05T17:19:28Z
Osote gọvanọ Kano steeti etinyela akwụkwọ arụkwaghị m taa
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ndi agha Naịjirịa etiela ndị ọchịehi mmanwụ na Benue steeti. Isi ulọọrụ ndị agha Naịjirịa kwuru na ha meriri ndị ọchịehi ahụ n'agha egbe ha abụọ kwatara ebe ha gbagburu ụfọdụ, ụfọdụ agbalaga. Ndi agha Naịjirịa etiela ndị ọchịehi mmanwụ na Benue Naịjirịa Osote gọvanọ Kano steeti bụ Hafiz Abubakara agbala arụkwaghị m taa. Akụkọ BBC Igbo na-enyochakwughi na-ekwu na Abubakara tinyere akwụkwọ alụkwaghị mgbe ọ nụrụ na mmadị iri atọ na otu n'ụlọomeiwu ebinyela aka n'akwụkwọ ichutu ya. Akụkọ na-ekwu na ụlọomeiwu chọrọ ichutu ya maka na ọ na-akwadọ onye bụbụ gọvanọ steeti ahụ bụ Rabiu Kwankwaso bụ onye siri APC pụọ banye PDP. Akụkọ mba ofesi Ala ọma jijiji dị egwu awakpola Lombol n'Indoneshia, otu izuụka ka nke gburu mmadụ iri na ise mesiri. Some buildings, including this shopping mall, were damaged in the earthquake O metụtarakwara ndị agbataobi ha na Bali ebe ndị ọrụ gọọmenti gwara ndị mmadụ ka si n'akụkụ mmiri pụọ. N'egwuregwu, Ọgba bọọlụ mba Snegal bụ Demba Ba ebela nwịị na a kpasoro ya oke agbụrụ na China ebe ọ na-agba bọọlụ ugbua. Ba gbaara West Ham, Newcastle na Chelsea n'asọmpi Premia Lig Onye nleta ya bụ Wu Jingui kwuru na ọgba bọọlụ otu egwuregwu Yatai gwara Demba ajọ okwu ụnyaahụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa:
[ "Kano steeti", "Naijiria", "Indonesia", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Alaọmajijiji", "Benue steeti", "Ọgụ ndị na-achịehi", "Kano" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45098810
Kedụ ihe na-etiri ndị ntọọ egwu ha na-agba?
Ndị ọkammụta ekwuola na ọ bụ oke mpụ butere ọtụtụ ihe ọjoo gụnyere ụzọ ntọ ọhụrụ ji eme na Naịjirịa.
2018-08-07T20:30:20Z
Nwaanyị tọrọ onwe ya, ebe ụra buru onye ntọọ ọzọ ṅụrụ Tramadol
Edgal Imohimi Kọmishọna ndị uweojii na Legos steeti bụ Edgal Imohimi kwuru na ha ebelatala ike ndị otu badoo na-akpa n'Ikorodu Ndị uweojii nwụchiri Nwaanyị tọro onwe ya iji nata di ya nde naịra 15 na Ogun state, ebe aka kpara onye ntọo ebe ọ gara ịtọrọ mmadụ ma ụra buru ya ka ọ ṅụchara ọgwụ ike Tramadol. Mana ndị ọkachamara n'ihe gbasara omume ndị mmadụ bụ psychologist ' na bekee na-ekwu na ụdị agwa bụ oke mpụ na ajọ enyị bụ ihe kpatara ya. A gbapụtala nna Mikel Obi n'aka ndị ntọ ọzọkwa Femi Joseph na ndị otu ya ji egbe wakpo ọdọahịa ọgwụ ịtọrọ onye nwe ya mana ụra buru Joseph ka ọ nụchara tramadol e nwetara n'ụlọ ahịa ọgwu ahụ. Dị ọkpa ahụ kọwara na oge ha batara onye nwe ụlọ ahịa ọgwụ ahụ tiri mkpu ma si ụzọ azụ ụlọ gbaa ọsọ. Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ondo steeti sị, "Mana dịka ha enwetaghị ihe ha chọrọ, otu n'ime ha bidoro sọwa ganị ganị n'ihi tramadol ọ ṅụrụ. "O rahụrụ ụra awa 24 ka ọ ṅwụchara ya. E nwetakwara mkpọ tramadọl n'akpa ya." N'aka nke ọzọ, otu nwaanyị aha ya bụ Hadijat Kabir na mmadụ abụọ ndị ọzọ gụnyere otu nwoke na nwaanyị ọzọ kpara nkata aghụghọ na ndị ntọrị ji ya ma naa di ya nde naira 15. Kọmishọna ndị uweojii na legos steeti bụ Imohimi Edgal, kwuru na ọ bụ mkpesa di ya wetara mere ka ha bido nyocha were chọpụta na ọ bụ nwunye ya na ndị omekemo kpara nkata ahụ. Okammuta n'ihe gbasara omume mmadụ nakwa onye nkuzi n'Ebonyi State University bụ Nnachi Amos kwuru, na ọ bụghị isi mmebi kpatara ụdị akwa kama"Ihe ọjọọ bara ụba ugbua. Ụfọdụ bụ mkparita ọjọọ site na inwee ajọ ọyị." Ogbo ya nọ na Federal Neuro-Pychiatric Hospital dị na Yaba, Legos bụ Chinyere Okonkwo kwenyere n'ihe Amos kwuru. "Isi zuru ha oke. I lee anya, ọrụ ntọrị abụghị ọrụ dị mfe. Mpụ na ajọọ ihe karịrị." Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ozubulu Church Massacre: Otu afọ agafeela Nwoke na nwaanyị enwere ike ịbụ enyi nkịtị? Ihe ndị ị na-ekwesịghị ime n'akụkụ onye Igbo
[ "Legọsị", "Naijiria", "Ondo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45109772
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Onyeisi ụlọọrụ Inec atọọla ngwugwu
Ndị sinetọ 48 dere aha ha ikwado Saraki na Ekweremadu.
2018-08-08T07:27:27Z
Onyeisi ụlọọrụ Inec Mahmood Yakubu akụwaala akụ oyibo nsugbe
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ihe nkiri na-eme n'ụlọomeiwu sineti ka kpụkwa ọkụ n'ọnụ. Akụkọ apụtala na ndị sinetọ mmadụ iri anọ na asatọ debere aha ha n'akwụkwọ na ha akwadoghi ichutu Saraki na Ekweremadu. BBC Igbo amaghị ka akwụkwọ a bụ eziokwu maka na anyị enwetaghị ya n'aka anyị. National Assembly: Anyị ga-enyocha ihe mere n'ụlọọrụ ndị omeiwu n'ụtụtụ a-Osinbajo 'Njọ' ise Lawal Musa Daura mere butere ọdịda ya 'Ihe mere Osinbajo jiri chụọ onyeisi DSS n'ọrụ Ebe ọzọ na Naịjirịa Onyeisi ụlọọrụ Inec Mahmood Yakubu akụwala akụ oyibo nsugbe E mere ọkammụta Mahmood Yakubu onyeisi Inec n'ọnwa ọktoba afọ 2015 O kwuru na ndị ntorobịa hie asaa n'anya jiri ọnụọgụgụ ha tụnyere otu onye vootu na 2019, ị mara na ha ga-ekwu onye ga-emeri. Akụkọ mba ofesi Agbanyeghi na a machiela ude na-eme mmadụ ọcha na mba UK, ndị mmadụ ka na-erekwa ya. Otu ndị ahụ a jidere na mbụ ma taa ha ahụ bụkwa ndị ka na-ere ya bụ ude dị njọ n'ahụ mmadụ na UK N'egwuregwu, Chelsea ga-anọ ọnwa atọ tupu ha ebido ime nke ọma ọzọ. Maurizio Sarri na-anọchi Antonio Conte dịka onye nkuzi ndị Chelsea Onye nkuzi ọhụrụ otu egwu bọọlụ Chelsea nwere bụ Maurizio Sarri ekwuola hoha na o nwereike iru ọnwa atọ tupu Chelsea akpawa ike ọzọ. Sarri kwuru na asọmpi Iko Mbaụwa mere na ya na ndị ọgba bọọlụ ya enwebeghi mmekọ kamgbe. Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa:
[ "Chelsea", "United Kingdom", "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Abuja" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45117741
Thibault Courtois awụfeela Real Madrid
Thibault ga-ebido ichere Real Mdrid bọọlụ ka ha na Chelsea nwere nkwekọrịta gbasara ya.
2018-08-08T20:20:20Z
Real Madrid: Courtois ahapụla Chelsea wụfere
Thibaut Courtois Courtois dị afọ 26 cheere Chelsea goolu afọ asaa, site n'afọ 2011 ruo 2018 Real Madrid azụrụla Thibaut Courtois bụ oche goolu, n'aka Chelsea. Courtois bụ onye ritere erere 'Ọkachasị eche goolu' n'Iko Mbaụwa nke 2018, kwụbara ndị mmadụ ọtọ na mkpịsị ụkwụ ha ka ha na-enyo ịma ebe ọ ga-agba bọolụ ma afọ bọọlụ ọhụrụ bido. Ị ma ihe Ronaldo jiri chịrị ọgbọ ugbua? Chelsea na Man City ga-achịpụ ya Iji kpọbata ya n'otu ha, Real Madrid dere "Anyị na Chelsea enweela nkwekọrịta gbasara ngafete @ThibautCourtois, onye ga-anọnyere anyị afọ isii." Chelsea n'onwe ha kwuru sị "N'abalịa, anyị na Real Madrid ekwekọrịtala na Thibault Courtois ga-esonye ha, ma ha na ya nwee nkwekọrịta nakwa ma o mee ọfụma na nyocha ahụike ya. Iji mee ka nke a dị ire, Mateo Kovacic ga-esonye Chelsea n'obibi (loan) nke otu afọ. Cheta na o teela ndị mmadụ na-eche ịnụ ma ọ ga-agafe Real Madrid, ma ọ ka ga-agbara Chelsea. Akụkọ ga-amasị gị Godswill Akpabio: Lee ihe ndị na-akpọtụ maka ọpụpụ ya Antonio Conte: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọchụchụ ya Gịnị ka ọchụchụ Amaju Pinnick dịka onyeisi NFF pụtara?
[ "Real Madrid", "Chelsea", "Egwuruegwu", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45125612
Akụkọ dị mkpa mere n'ụtụtụ a: Di na nwunye erela nwa ha
Ndị uweojii n'Imo steeti anwụchiela di na nwunye rere nwa ha na ụmụaka ndịọzọ n'Imo steeti.
2018-08-09T07:17:57Z
Anwụchiela di na nwunye na-ere ụmụaka n'Imo
Akụkọ ndị dị mkpa Aka akparala otu di na nwunye n'Imo steeti maka orure ụmụaka gụnyere nwa ha nwoke. Ndị uweojii nwuchiri Ugochukwu Nwachukwu na nwunye rere nwa ha bụ Marvellous n'ime obodo Umueme Obike n'okpuruọchịchị Ngọr Ọkpala A na-achọ nwata a kemgbe mbido Julaị Onyeisioche otu ndị gọvanọ Naịjirịa bụ Abdulaziz Yari nke Zamfara steeti akatọla mmachi ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka bụ EFCC tinyere n'akụnaụba Benue steeti. Ọ sị na atụmatụ a ga-etinye steeti ahụ n'ezigbo ahụhụ. EFCC kwuru na ọ bụ maka mpụ gọọmentị Benue na-eme ka ha ji machie ya bụ mmachi. N'akụkọ ofesi, Xi Jinping, onyeisiala China na Donald Trump, onyeisiala Amerịka Ego mmanụ agbịdị adatuola dịka mba China na mba Amerịka na-ama aka gbasara ọzụzụ n'orure ngwa ahịa ha. Mba China manyere pasentị iri abụọ n'ise n'elu ụgwọ ụtụ mba Amerịka ga-akwụ iji bubata ya bụ mmanụ na Chịna. N'egwuregwu, Kepa Arrizabalaga bụ bụ onye nche bọọlụ otu Athletic Bilbao ebinyela aka n'otu Chelsea dịka onye nche ọhụrụ ha. Cheta na Thibault Curtois cheburu Chelsea bọọlụ agafeela n'otu Real Madrid ugbua. Gee nkeji nke ụtụtụ a: Ihe nkiri nke taa:
[ "Chelsea", "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ụmụaka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45150729
Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Rochas ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala na 2023?
Gọvanọ Rochas Okorocha kwuru na ọ ga-anata nkwado n'aka ndị si mpaghara ndị ọzọ na Naịjirịa.
2018-08-10T18:54:25Z
Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Ama m na ndị Igbo agaghị akwado m ma m zọọ onyeisiala na 2023 - Rochas
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Rochas ọ chọrọ ịzọ onyeisiala? Gọvanọ ndị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ bụ ya kacha nwee ohere ịbụ onye Igbo mbụ ga-abụ onyeisiala Naịjirịa ma ọ zọọ na 2023. Mana o kwuru na ọ ma na Ndigbo agaghị ekwe akwado ya, ma kwuo na nkwado ya ga-esi n'aka ndị si mpaghara ndị ọzọ. O kwukwara na enweghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị Igbo ọzọ a ma etu e si mara ya na mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ. Rochas kwuru nke a ka ya na ndị ntaakụkọ zukọrọ n'ụlọọrụ ya n'Owere nso nso a. Ebe ọzọ na Naịjirịa: Ụmụada ise a si Regina Pacies Secondary School Onitsha, 'Anambara steeti meriri n'asompi Technovation 2018 Naijiria eturula ugo dịka ọkaibe n'ụwa niile n'asompi Technụzụ e mere na mba Amerika ụnyaahụ. Ụmụada ise si ụlọakwụkwọ Regina Pacie dị na Ọnicha, nọchitere Naijiria ji technuzu a kpọrọ, 'FD Detector,' ha mepụtara iji buso nsogbu ọgwụ adigboroja ọgụ n'ala Naijiria, were turu ugo dịka ọkaibe n' asompi Technovation. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ụmụaka Igbo eturula ugo ọkaibe na technụzụ na mbaụwa Mba Ofesi: Ndị uweojii na mpaghara obodo Fredericton dị na mba Canada, anwụchiela otu onye gbagburu mmadụ anọ gụnyere ndị uweojii abụọ. Ha ka na-enyocha ihe butere ịgba egbe a. N'egwuregwu, FIFA amachiela Kalusha Bwalya bụbu onye nchịkọta nakwa ọgba bọọlụ otu egwuregwu Zambia, afọ abụọ. Ha machiri ya ka ha nyochapụtara na ya na Mohammed Bin Hammam bụ onye Qatar FIFA machiri ndụ ebighịebi mere nrụrụaka. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa: Ị hụla nwaanyị Igbo a na-eji ịnya ụgbọala akpa ego?
[ "Tekinụzụ", "Naijiria", "Canada", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45186251
Onye ntọ ṅụrụ ọgwụ ike anwụọla
Ndị uweojii nọ n'Ondo steeti ekwuola na onye ntọ na-atọghị onye ọ biara ịtọ maka ogwu ike ọ nwụrụ anwụọla.
2018-08-14T15:28:03Z
Onye ntọ ṅụrụ ọgwụ ike anwụọla ka ụbọchị itoolu gachara
Onye na-arahụ ụra Dọkịta BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ya bụ onye ntọ kwesiri ịnata ọgwụgwọ Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ondo bụ Femi Joseph agwala ndị ntaakụkọ na onye ntọ ṅụrụ ọgwụ ike anwụfụola dika "News agency of Nigeria" si depụta. Cheta na ọ na-arahụ ụra kamgbe ndị uweojii nwụchichara ya n'Ọgọstụ 5 ebe a na-ere ọgwụ. Joseph kwuru na onye ntọ a nwurụ n'ụlọọgwụ dị na steeti ahụ ebe ndị dọkita Bekee nọ na-agba mbọ ịgwọ ya. Onye ntọ kwesiri ịnata ọgwụgwọ - Dibia bekee Onye ọkaiwu Evans esepụla aka n'ikpe ya Kedụ ihe na-etiri ndị ntọ egwu ha na-agba? N'ọnụ ya, "Onye ntọ a a na-enyocha nwụrụ ka abalị itoolu anyị jiri nwụchie ya gachara. Anyị chere na anyị ga-agwọnwu ya ka o wee nyere anyị aka na nyocha anyị na-eme, mana ọ nwụrụ ụnyaahụ.'' "Ihe a nwere ike si n'ọgwU ike ọ ṅụrụ. "Anyị ji ohere a adụ ndị nne na nna ọdụ ka ha mara ụdịrị enyi ha na-enwe." Akukọ kwuru na onye ntọ a gara ịtọ onye na-ere ọgwụ mana onye ahụ riri mbombo ọsọ. Ya na ndị otu ya mechara nara otu onye bụ Daudu Wale ọgbatumtum ya, ebe ọ gara ịzụta ọgwụ ebe e nwudere otu onye n'ime ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gịnị ka ị ga-agwa Nnamdi Kanu ma ị zute ya n'ụzọ? A tufuru nwa ọhụrụ n'Ọnịcha taa Buhari na Osinbajo ha ga-azọkọ na 2019? Akaọrụ ise ị nwere ike iji N10,000 bido
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii" ]
https://www.bbc.com/igbo/45186257
Ndị Ghana a na-achụpụ ụmụ Igbo na-ere ahịa na be ha?
Ụmụafọ Naịjiria na-ere ahịa n'ahịa Magazine na Ghana, nọ n'ụlọ ha kemgbe a gbachiri ahịa ahụ n'ime izuụka abụọ gara aga ga-aga.
2018-08-15T18:15:39Z
Ụmụ Igbo nọ Ghana: Gọọmentị Ghana na-akpagbu anyị
Ahịa Makola na mba Ghana Kizito Obiora bụ onyeisi ndị Naịjirịa na-azụ ahịa ebe ahụ gwara BBC Igbo na ụmụafọ Naịjiria na ndị ogbo ha n'obodo ahụ enweela nkwekọrịta na udo ga-achị. Maazi Obiora kwuru na nke a mere maka esemokwu dara n'etiti ndị Naịjirịa na ndị Ghana. Technovation: Lee ụlọakwụkwọ ụmụaka ise ahụ turula ugo ọkaibe n'asompi technụzụ SARS: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mwogharị ha Ihe mere Amerika anaghị enye visa n'Abuja ugbua Ndị ọchịchị Ghana e nyela iwu maka etu ndị Igbo na-ere ahịa ga-esi na-ere ahịa n'obodo ha. Ọ si na nsogbu a bidoro ka gọọmenti Ghana wetara atụmatụ na ndị Naịjirịa na ndị mba ọzọ kwesịrị inwe ihe Bekee kpọrọ "equity" ruru nde dọla. Onye wepụtara atụmatụ a bụ minista na-ahụ maka azụmahịa. Obiora kwuru na agbanyeghị na atụmatụ abụghị ihe ọhụrụ, maka na gọọmenti rituru n'ọchịchị chọrọ ime ya, ozighi ezi ugbua etu ozighi ezi mgbe ahụ. Ndị ahịa akụrụngwa na-esikarị mba ofesi enweta ngwaọrụ ha N'agbanyeghị na ahịa ga-emepe echi, Obiora sị na ọ bụ nkata gọọmenti Naijiria na nke Ghana kpara mere ha jiri gbanyụọ ọkụ. Ma kwukwa na ha si ụzọ ọzọ bata. Ndị ụka Ekwensu na-apịasu Naịjirịa Nyocha ndị na-enweghị "equity" nke ga-amalite echi. Otu onye sị na ihe a ga-emetụta ya bụ Nwafor Akajiofor, bụ onye na-azụ ahịa n'Ahịa Magazine. Akajiofor kwuru na okwu 'resident permit na equity' bụ atụmatụ gọọmenti Ghana ji chọọ ịchụpụ ụmụ Naijiria na Ghana. O kwuru na akwụkwọ na-enye ikike ibi na Ghana bụ 'resident permit' abụghị ihe dị mfe inweta. "Resident permit ahụ na-ericha 200,000, mana inweta ya abụghị ebe o biri." Obiora na onwe ya sị na ihe na-agba anyammiri bụ na iwu Ghana hibere bụ na ndị mba ọzọ agaghị azụ ahịa n'ime ahịa. "Ndị nwere akwụkwọ zuru ezu agaghị aganwu n'ime ahịa zụọ ahịa, ọ bụ naanị n'okporoụzọ ka ha ga-enwe ụlọahịa, dịka iwu a siri kwuo." Dịka o si kwuo, ọ bụrụ na ndị Ghana gaa n'ihu sobe iwu a, ọtụtụ ụmụafọ na mba ahụ ga-ala makana ha agaghị emenwu ihe dị na ya.
[ "Ịji ego achụ ego", "Azụmahịa nke kọmpụta", "Ghana" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-45199775
Victor Moses eyipụla uwe o ji agbara Naijiria bọọlụ
Victor Moses ka ga na-agbara Chelsea bọọlụ maọbụ klụb ọzọ n'ọdiniihu, mana ọ gaghị agbara Naịjirịa.
2018-08-15T19:54:40Z
Victor Moses dị afọ 27 alaala ezumike nka n'egwuregwu bọọlụ Naijiria
Victor Moses Victor Moses ọ ga-agbara Naịjirịa bọọlụ ọzọ ma a kpọkuo ya? Ka Moses kwuputara na Twitter na ọ wụsala boot o ji agbara Naịjirịa bọọlụ, ọ bụrụla ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ. Moses dị afọ 27, gbaara Naịjirịa bọọlụ ugboro 37 ma nye goolu ugboro 12, n'agbanyeghị na o bu ụzọ gbaara Ịngland na ngalaba U-21. Ị ma ụmụnwaanyị ji ndị Super Eagles n'ọrụ? World Cup 2018: Ihe ndị Super Eagles mere ka ndị Kroeshia merichara ha World Cup 2018: Ugo Naịjirịa efeliela ọzọ Iji kwuputa maka 'boot' ọ wụsara, Moses dere sị "ọtụtụ ihe ọma merela na ndụ m mere ka m yi uwe ndị Super Eagles, agaghị m echefu ya na ndụ m niile. "Mana ugbua bụ oge kacha mma iji lekọta ezinaụlọ m nakwa klụb ebe bụ ụlọọrụ m, nakwa inye ndị na-etolite ohere iji pụta n'ọgbọ mee ọfụma. "Daalụ maka ihe niile, ya gaziere otu a n'ọdịniihu." Cheta na Moses so Naịjirịa bulie Iko mpaghara Afrịka n'afọ 2013, ma sorokwa ha gaa Iko Mbaụwa abụọ n'afọ 2014 na nke 2018. Nne na nna Victor Moses nwụrụ na mwakpo ndị omekome mere na Kaduna oge ọ dị naanị afọ 11 Moses nyere goolu abụọ n'asọmpi Iko mpaghara Afrịka n'afọ 2013, nke nyere Naịjirịa ikike iji gafee agba mgbapụ. O nyekwara otu goolu ka Naịjirịa na Ajentina zukọrọ n'Iko Mbaụwa a gbara na Rọshịa na 2018. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị 2019 Election: Lee ndị dị afọ 18-40 chọrọ ịnọchite ndị Ebonyi steeti Technovation: Lee ụlọakwụkwọ ụmụaka ise ahụ turula ugo ọkaibe n'asompi technụzụ
[ "Egwuruegwu", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45218129
Gọọmenti ehiwela abalị abụọ maka ezumike n'izu na-abịa
Gọọmenti etiti ekwupụtala na ụbọchị Tuuzde na Wenezde izuụka na-abịa ga-abụ ụbọchị ezumike maka oriri Eide-El-Kabir.
2018-08-17T08:53:58Z
Eid-El-Kabir: Gọọmenti abalị abụọ dịka ụbọchị ezumike
Ndị gara ịzụ ebule Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n'ime ala anyị bụ Abdulrahman Dambazau kwupụtara nke a ụbọchị Tọsde n'Abuja n'akwụkwọ si n'ụlọọrụ ya n'aha gọọmentị etiti. Eide-El-Kabir bụ emume sọ na ndị dịkachara mkpa na ndụ ndị na-ekpe ụka Alakụba na-eme. Ihe gị na ụmụ gị nwere ike ịme n'oge ezumike Emume nke ha na-egbukarị ebule bụ emume ha ji echeta nrubeisi Ibrahim(Abraham) rubere site n'ikwenye iji nwa ya chụọrọ Chineke aja. Dambazau rịọrọ ụmụ Naijiria ka ha were ohere a makụọ ifunanya na ịchụ aja maka ịdịnotu na ọganihu Naijiria. Ọ rịọkwara ndị Naijiria nọ n'ụlọ na ndị bị n'ọhịa ka ha kwado ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari. Dambazau kpere mmadụ niile ekpere ihe ọṅụ n'oge emume a. Akụkọ ga-amasị gị 'Kọngị' ebugala nwoke n'akwa ọrịa nwunye ya n'ụlọọgwụ Nwoke a ga-azanwu aha nna nwunye ya n'ala Igbo? Ndị Ghana a na-achụpụ ụmụ Igbo na-ere ahịa na be ha? Tupu i gbanye igwe i ji amụ ọkụ, lee etu ị ga-esi chekwaa onwe gị
[ "Islam", "Naijiria", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45227257
Ndị uweojii n'Abia anwuchiela nwoke isi na-edina onwe ha
Ndị uweojii nwụchịri ha na ụlọọrịrị na ọṅụṅụ mana ha ka na-agọ ebubo a.
2018-08-17T20:10:18Z
Ndị uweojii n'Abia anwuchiela nwoke isi na-edina onwe ha
Ọtụtụ ala na mba ofesi anabataala ndị nwoke na nwoke maọbụ nwaanyị na nwaanyị na-eme mmekorita Ndị uweojii n'Abia steeti anwụchiela mmadụ isi ha na-ebo ebubo na ha bụ ndị na-eme mmekọ nwoke na nwoke. Cheta na iwu ala Naịjirịa kpebiri na onyeọbula mere udi ihea ga-aga mkpọrọ ruru afọ iri na anọ. Ndị uweojii kwuru na ha nwuchiri ha ebe ha nọrọ n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ na-eme mmọkọrịta. Di na nwunye irikọ nri: Gịnị ga-eme nwoke Igbo ajụ nri? 'Ndị ụlọ anyị sị m ma alọtazina ụlọ ọzọ ma m ahụghị di' Mana o nwere ndị n'ime ndị a kwuru na ebubo a abụghị eziokwu. Ha kwuru na ha bịara ebe a maka mmemme ụbọchị ncheta ọmụmụ otu n'ime ha. Onye ọzọ aha ya bụ Fred Ndubuisi bụrụkwa onye na-eme mmemme ụbụchị ncheta ọmụmụ gwara ndị nta akụkọ na ha banyere ọnụmara n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ a maka ị yi uwe ha ga-eji were mee mmemme a. Ndubuisi kwuru na oge ahụ ka onyeisiụlọ oriri na ọṅụṅụ bata n'ebe ahụ nakwa bọ ha ebubo na ha bu ndị na-eme mmeko nwoke na nwoke. Mana kọmishọna ndị uweoji na steeti ahụ bụ Anthony Ogbizi kwuru na ha bụ ndị otu ọjọ na kwa na ụlọ oriri na ọṅụṅụ na weta akaebe ha ga-eji nwe kpe ha n´ụlọikpe. Akụkọ ga-amasị gị "E werela m ụgbọelu gakwuru di m n'ụlọọrụ ya maka 'konji' Anyị ga-amachị ụnụ n'ike- FIFA na-adọ Naịjirịa aka na ntị
[ "Naijiria", "Abia Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45229360
Akụkọ kachasị n'abalị: Umar Ganduje abụrụla 'agụ na-eche mba' n'ala Igbo
Idemmiri gburu ọtụtụ mmadụ ebe ụlọ dara na Jabi dị n'ime Abuja. Ị ga-agụ ya n'akụkọ a.
2018-08-17T20:28:13Z
Umar Ganduje abụrụla 'agụ na-eche mba' n'ala Igbo
Umar Ganduje abụrụola 'agụ na-echemba'n'ala Igbo Eze Eberechi Dick bụ onyeisi otu ndị eze si ọwụwa-anyanwụ etuola gọvanọ Kano steetị bụ Abdullahi Umar Ganduje ugo dika 'agụ na-eche mba 1' nke Ndị Igbo. Otu a kwuru na ha turu Ganduje makana ọ gbara mbọ hụ na ndị Igbo na ndị be ya bi na Kano na-ebi n'udo. Idemmiri egbuola ọtụtụ mmadụ n'India Na mba ofesi, akwa adaala n'obodo Kerela n'ala India ebe nnukwu ide mmiri gburu mmadụ nari atọ na iri abụọ na anọ. Ugbua ndị gbata gbata na-anwa ịzọ ndụ ndị ọzọ biri n'obodo ahụ. Ugbua mmadụ karịrị puku narị abụọ ka idemmiri a chụpụrụ. Ntuliaka 2019 dị n'aka ndị Naịjirịa -INEC Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naijiria bụ INEC ekwuola na ntuliaka Naijiria ga-eme n'afọ 2019, ga-aga nke ọma ma ọ bụrụ na onye ọbụla jikọtara aka rụọ ọrụ ọfụma mgbe oge ahụ ga-abịa. Emeka Ononamadu bụ onyeisi ụlọọrụ INEC kwusiri ike na ụlọọrụ INEC niile n'ala Naịjirịa dị njikere ịza ajujụ onyeọbụla nwere ugbua gbasara ntuliaka na-abịa. Ụlọ dara na Jabi egbuola mmadụ abụọ Mmadụ abụọ anwụọla, ebe a na-achọ ihe ruru mmadụ iri ka ụlọ elụ dachara na Jabi dị n'Abuja. Akụkọ na-ekwu na ụmụaka na ndị na-ere nri so na ndị ka nọ n'okpuru ụlọ a dara ada. Kevin de Bruyne ga-eji ọnwa atọ pụọ n'asọmpị niile N'egwuregwu, Kevin de Bruyne onye otu Manchester City agaghị eso n'asọmpị ọbụla ruo ọnwa atọ maka ahụ o meruru n'ụkwụ. Gee akụkọ anyị nke abalị a Lee ihe nkiri nke taa
[ "Naijiria", "India", "Abuja" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-45238120
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Nlaghachị Buhari ọ ga-edozi obodo?
Ndị ochịehi wakporo ndịagha Naịjirịa; mba Mourinho nakwa aka Ohaneze Ndigbo dọrọ Ipob na ntị so n'akụkọ a.
2018-08-19T08:44:59Z
Nlaghachị Buhari ọ ga-edozi obodo?
Buhari alọtara Naịjirịa Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari lọtara Naịjirịa ụnyaahụ. Cheta na ọ gara njem ezumike n'ala UK n'ụbọchị atọ n'ime ọnwa Ọgọọst. N'azụ ya, onye nnochitere anya ya bụ Ọsote Onyeisiala Yemi Osinbajo mere ọtụtụ ihe mere ka ọtụtụ ndị mmadụ na-aja ya ọma. Mana echiche ndị mmadụ ugbua bụ ma Buhari ga-eme emegharị ụfụdụ mkpebi Osinbajo kpebiri oge ọ bụ onyeisiala? Ndị ọchịehi wakporo anyị - ndịagha Naịjirịa Onyeisi atụmatụ nchekwa ndịagha Naịjirịa akpọrọ "Operation Whirl Stroke" na Bekee bụ Gen. Adeyemi Yekini kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị eche na ha bụ ndị ọchịehi wakporo ndịagha n'obodo Guma n'ime Benue n'ụbọchị ole na ole garaaga mana onweghị onyeọbụla nwụrụ na yabụ mwakpo. Ipob kwadoro onwe ụnụ ugo - Ohanaeze Ndigbo Ụnyaahụ Ohaneze dọrọ Ipob aka na ntị, na ọ ga-adị ha mma ma ha kwụsi ịbụ ha ọnọ . Emeka Attamah bụ ọnụ na-ekwuchiri onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo si na ha aghọtaghị ihe mere Ipob na-akatọ ha oge ọbụla, ha kpọrọ otu dị icheiche n'ala Igbo ka ha nye Ipob ndụmọdụ nke ha. Ala amaala jijiji na oshimili Pacific Na mba ofesi, n'akụkụ mba Fiji, ala mara jijiji n'etiti oke oshimili Pacific, mana onweghị onye meruru ahụ na mkpakpa a. Ndị ọkachamara na ihe gbasara ala ọma jijiji adaala obi jụụ makana ha na-ekwu na ụdị ihea agaghị eme ọzọ ebe ahụ nso nso. Mourinho akọọla Man City ọnụ N'egwuregwu, Jose Mourinho bụ onye nchịkọta otu Manchester United ekwuola na Manchester City nwere ego mana ha anaghị eji ego ahụ azụta ugwu. O kwuru nke a maka ihe nkiri Manchester City meputara ọhụrụ nke akpọrọ All or Nothing. O kwuru na ha katọrọ ya na yabụ ihe nkiri. Gee akụkọ anyị Lee ihe nkiri anyị
[ "Naijiria", "Benue steeti", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45244159
Chụwa ndị ohi n'ogbe gị - Ihe PDP gwara APC
Ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadụ Buhari kwere nkwa na ya ga-achụ ndị nrụrụaka ọsọ n'ike, PDP sịrị ya buụzọ tinye anya n'ụlọ nke ya.
2018-08-20T07:41:06Z
Ihe mere PDP ji si ka APC bụrụ ụzọ nwụchie ndị ohi nọ n'ogbe ha
Ikpe mpụ na nnrụrụaka Ndị Naịjirịa na-ekwu na ikpe ekwesịghị ịmụ anya maọbụ mee iru abụọ Na nlọta Buhari ụbọchị Satọde nke a gara aga, okwu dapụrụ ya n'ọnụ bụ na ya ga etinye uche n'okwu ndị aka ha dị na mpụ, aghụghọ na nrụrụaka nke ọ sị na ọ bụ kachasị enye Naịjirịa nsogbu. Buhari sị na olileanya ya bụ na ọtụtụ ndị aka ha dị na mpụ ga-aga mkpọrọ. EFCC chọkọtara ego karịrị N500BN na 2017 Buhari ebinyela aka n'iwu ịkpachi ego Naijiria e zufuru Ndi ntaakụkọ jụrụ Buhari ihe ndị Naịjirịa na-ele anya na nlota ya, ọ sị "Ọtụtụ ndị Naịjirịa nwere olileanya na anyị ga-atụ ndị ohi tinyere Naịjirịa na nsogbu mkpọrọ. E che m na ọ bụ ihe ha chọrọ, nke mere m ga-eji mee ya." Mana, ndị otu pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) asaala okwu a sị na Buhari kwesiri iji aka ya ndị mmadu na-asi na ọkwụ ọtọ chọwa nrụrụaka dị na pati ya bụ All Progressive Congress (APC), ọkachasị ndị otu ya eboro ebubo mpụ na aghụghọ. Dasuki so na ndị aka ji maka mpụ, mana ndị PDP sị na ọ bu mmegide N'akwụkwọ onye odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Kola Ologbondiyan binyere aka, PDP sị ka Buhari nye ohere ka-enyocha mpụ eboro onye bubụ onyeisi ndị DSS bụ Lawal Daura, nke metụtara onye bụbu odeakwụkwọ Naịjirịa bụ Babachir Lawal na nke metụtara Yusuf Usman bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ịkwụnye ụgwọ ahụike. PDP sị na Buhari egosibeghi aka eji achụ mpụ na aghụghọ kemgbe ọ banyere ọchịchị. Mana, onye odeakwụkwụkwọ APC bụ Yekini Nabena gwara ndị ntaakụkọ ụnyaahụ na ndị Naịjirịa nwere ohere ide akwụkwọ ka ngalaba na-ahụ maka mpụ na aghụghọ tinye anya n'ihe banyere onye ọbụla eboro ebubo. "Ọbụghị eziokwu na Onyeisala na-achụ ndị pati na-anọghi n'ọchịchị mgbe o kwuru okwu maka ndị ga-aga mkpọrọ. Anyị niile nọ na mba ma maka onye sinetọ bu onye APC na-aza ọnu ya maka mpụ. Mgbe Onyeisiala kwuru maka ịga mkpọrọ ọbughị sọ ndị anọghị n'ọchịchị ka o bu n'uche." Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị oyi egwu egbuola ọtụtụ mmadụ na Borno state Ịbụ ọnụ: Ohaneze adọọla Ipob aka na ntị Ihe ndị uweojii mere ụmụnwaanyị Ipob na-eme ngagharịiwe
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Mpụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45252915
2019 Election: Eji m igodo e ji agbape akụnaụba Naịjirịa - Moghalu
Kingsley Moghalu na-azọ ọchịchị onyeisiala chọrọ ịgbanwe ọtụtụ ihe na Naịjirịa.
2018-08-21T08:34:27Z
2019 Election: Naịjirịa kwụsị ịtụkwasị obi n'elu mmanụ agbịdị - Moghalu
Nwaafọ Igbo na-azọ ọkwa ọchịchị Naịjirịa bụ Kingsley Moghalụ, gwara BBC Igbo na o nwere mkpịsị igodo e ji agbape akụnaụba Naịjirịa. O kwuru na oge eruola mgbe a ga-akwụsị ịtụkwasị obi n'elu mmanụ agbịdị.
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/45268166
'Prostate Cancer egbuola ọtụtụ nwoke n'Naịjịrịa'
Ndị mmadụ emela ngagharị iwe megide ọrịa Prostate Cancer n'Okpara square Enugwu.
2018-08-22T10:43:11Z
Nwoke ọbụla gbara afọ 40 wee gbagobe, kwesịrị ịga nyochaa Prostate ya
Ọtụtụ ndị mmadụ agbakọtala ọnụ n'okpra square dị n'Enugwu iji mee ngagharị iwe megide ọrịa Prostate Cancer. Proatate Cancer bụ ajọ ọrịa na-adị n'akpa mamịrị ụmụ nwoke, nke na ọtụtụ mmadụ anwụọla na ya. Onye chikọbara ngagharị iwe otu "pink blue"ahụ bụ mazị Roncy Chidebe kwuru na ya na ndị otu ya chọrọ ka ụmụ nwoke niile tetanụ ụra, gaa nyochaa onwe ha.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45269484
Canada etinyela ndị Naịjirịa mgbochi
Ndị ọkaikpe na-amara gọọmentị ha aka maka ajọ agwa ha sị na ha a na-akpaso ndị Naịjirịa gbagara ọsọ ndụ na Canada.
2018-08-22T12:32:48Z
Canada etinyela iwu ga-eme ka ọ siere ndị Naịjirịa ike ịga mba ahụ
Kanada na Naịjirịa Ndị ọkaikpe ndị kanada sị ndị be ya na-emegbụ ndị Niajịrịa Mba Kanada etinyela iwu ọhụrụ maka ndị Naịjirịa batara mba ahụ maka ọsọ ndụ. Iwu a ga-eme ka ọhịa ahụ ịnweta ohere banye Kanada, mana ụfọdụ ụmụ Naịjịrịa si US gbaba Kanada ọsọ ndụ enwetere nkwado ndị ọkaikpe ụfọdụ na mba ahụ. Ọṅụ juru Amerịka, Kanada na Mekziko obi taa - Iko Mbaụwa 2026 A nwụchiela ndị Russia 13 kpatọsiri aka Ndị ọkaikpe a kwuru na agwa gọmenti ala ha na-akpasọ ndị Naịjirịa a gbatara ọsọ ndụ be ha jọgbụrụ ụdele ma sịgbuo nkakwụ. Ọtụtụ ndị Naịjịrịa si ogige oke ala ndị US piofere kanada n'ihe ruru ọnwa iri na asatọ, bụ ebe ha chọrọ enyemaka ikike dịka ndị gbatara ọsọ ndụ. Ihe kpanitere mbuso ndị ọkaikpe a kpọrọ onwe ha Canadian Association of Refugee Lawyers bụ agwa akpasara otu nwaanyị Naiịjrịa chọrọ iji ọsọ agbalahụ ịbe ugwu nwaanyị na be ha. Ndị ọrụ okwu ndị gbara ọsọ ndụ dị n'aka bụ Immigration na Refugee Board (IRB) nke Kanada sị na ya bụ nwaanyị etozughị ịnye akwụkwọ ikike maka na-okwesiri ịgbaga ya bụ ọsọ ndụ na mpaghara ebe ndị ọzọ na Naịjịrịa dịka Ibadan maọbụ Pọtakọtụ. Ndị otu ikpe mkpegharị IRB kpebiri na ya bụ ikpe bụ ịhe a ga-eji elegara anya na-ikpebị ikpe ndị ọzọ gbasara ndị si Naịjirịa gbata ọsọ ndụ bido ụgbụa gawazịa. Ndị ọrụ IRB enwebuola ụdị mkpebị a na isi ndị mba China, India nakwa Pakistan. Ndị otu Canadian Association of Refugee Lawyers na-eche na-iwu a ga-eme ka ihe tawanyega akpụ nye ndị sị Naịjirịa gbata ọsọ ndụ karịa ka ọ dị na mbụ. Lorne Waldman bụ ọkaikpe na Kanada Onye ọkaikpe Lorne Waldman gwara ndị ntaakụkọ Reuters na olu sụpịrịsụpịrị na "ya bụ mkpebi ezighiezi maka na ọ ga-eme ka ihe siere ndị ụfọdụ ike karịa ibe ha bụ ndị sị mba ọzọ". N'ezia, Kanada na ihe na-eme kemgbe afọ 2017 bụ mgbe ndị mmadụ bidoro siwe azụ ụlọ US piobatawa mba ahụ. Ihe karịrị mmadụ 30,000 epiobatala Kanada kemgbe ahụ dịka akwụkwọ ndị gọmmenti mba ahụ kwuru. N'ime ndị a, mmadụ 10,000 si Naijirịa nke ndị Kanada nabatara pesentị 33. Akụkọ ga-amasị gị Gọọmentị agaghị akwụ ndị NYSC puku naịra 50 ọbụla - Ngige Ọkaiwu Trump agbarala ya ọnya ogwu 'Anyị agaghị ekwe ka ndị nchekwa Naịjirịa memina anyị'
[ "Naijiria", "Canada", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45325142
Gịnị mere Jim Iyke ji ewu na soshal midia?
Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na a nwụchiri Jim Iyke ka ọ machara onye ọrụ ọdọụgbọelu ụra.
2018-08-27T18:54:52Z
Jim Iyke ọ dabara na nsogbu ndị uweojii?
Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na ndị uweojii nke ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed na Legọs anwụchiela Jim Iyke bụ omeiheonyonyo. Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Punch siri kwuo, anwụchiri ya mgbe ọ mara onye ụlọọrụ ọla mgbe ọ na-achọ ị me ya nyocha. Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ mara nwoke ahụ ọra ebe ọ na-achọ ịnyere ya aka mee ọsịsọ banye n'ụgboelu njem ya tupu ihe a eme. Ebony Life TV na Sony ebinyeela aka n'akwụkwọ 'Achọrọ m ịtọpụ Enugwu n'agbụ' - Kenneth Okonkwo Ọnụ na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ Dana Air bụ Kingsley Ezenwa kwuru na ihe a mere ma kwuo na atọghapụọla Jim Iyke dịka ọ rịọrọ biko. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na ọdọ ụgbọelu bụ Alabi Joseph kwukwara na atọghapụọla ya bụ omeiheonyonyo. Jim Iyke agaghịzi njem ya n'ihi okwu a.
[ "Nollywood", "Ịkpa obi aṅụrị", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45319234
Ihe Obi Onicha kwuru maka 'restructuring' dabara -Ezeife
Igwe Alfred Achebe si na ọ bụ ịhazịagharị Naịjirịa ka mkpa karịa ịzọ ndọrọndọrọ ọchịchị ị bu onyeisiala.
2018-08-27T19:49:29Z
Ezeife: 'Restructuring ga-eme ka Igbo ga n'ihu karia
Map of Nigeria Onyebụbu gọvanọ Anambara steeti bụ Chukwuemeka Ezeife ekwuola na ihazigharị Naijiria na mpaghara ga-ewelite mpaghara ọwụwa-anyanwụ karịa ịchọ ọkwa onyeisiala. Okwu Ezeife sochiri oku Igwe Alfred Achebe, Obi Ọnicha kpọrọ ka ahazigharị Naịjirịa ka mpaghara ọbụla gbaba mbọ onwe ha. Ụlọ omeiwu nta ga-emegharị usoro ntuliaka Inec akwadola ọnọdụ 119,973 maka ntuliaka 2019 'Anyị anaghị agba akwụkwọ ntuliaka ọkụ' N'okwu ya, Ezeife sị "Ọ bụrụ na ekewasia anyị nọrọ be anyị, ọ gaghị enwe onye ya na ibe ya ga na-ese, ndị ọbụla a nọrọ be ha dozie be ha." Ọ gara n'ihu kọwa na "Anyị nweta ọkwa onyeisiala, ọ chịcha pụọ, anyị etiwekwa mkpu. Mana alaghachi azụ n'ebe anyị nọ na mbụ na 1954 bụ na mpaghara(region) oge Okpara na Awolowo na-achị, ọ bụ oge ahụ enweburu ọchịchị na mpaghara ka Naijiria nwere ọganihu, ọ ga-aka anyị mma." Cheta na Igwe Achebe kwuru mgbe ọ gara ikele gọvanọ na-achị Plateau steeti bụ Simon Lalong na e kwesiri ịhazịagharị Naịjirịa etu ọ ga-adị ka mpaghara niile nwe ike na-enye onwe ya nri, na abụghị ị na-eche ka gọọmentị etiti nye ha. Ọ sara ajụjụ maka inye onye Igbo ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 wee si na udiri ihe ahụ abụghị nke dị mkpa. Igwe Achebe sị na-ekwesịghị ịna ekwu okwu ma onye ga-abu onyeisiala ọ bu onye Igbo, onye Hausa maọbu onye Yoruba, makana ihe kachasị mkpa bụ i hụ na onye banyere n'ọkwa ga-eme onye ka ibe ya. "Ekweghị m na atụmatụ onyeisiala Igbo, Yoruba maọbụ Hausa. Ọ na-ada ka ihe nkewa; makana ihe anyị chọrọ bụ onyeisiala ndị Naịjirịa họpụtara ka ọ rụọrụ anyi niile ọrụ." Igwe Achebe sị na ekwesiri ịkewa Naịjirịa n'udi ndị Briten si kewa ya mgbe ha na-achị Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ịha mmiri ọ bụ ihe na-eme n'ezie n'ala Igbo? Ụmụaka abụọ anwụọla n'Ebonyi maka kerosene adigboroja Ihe ị kwesiri ịma maka okpueze ala Igbo
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45301757
Lee ndị ise kwadoro nhazigharị Naijiria na mpaghara
Ụfọdụ mmadụ amalitela ịkpọ oku nhazi obodo a kpọrọ 'Restructuring' na bekee mana kedu uru ọ ga-abara Ndigbo?
2018-08-27T20:11:46Z
'Restructuring' a ga-aza ekpere Ndigbo n'okwu gbasara oke?
Igbo na nhazigharị obodo Naịjirịa Ndịgbo na ndị agbụrụ ọzọ zukọrọ n'Awka ịkpa maka "restructuring" Okwu ihazigharị Naijiria nke a kpọrọ 'restructuring' bụ ude na-ede na Naịjirịa kemgbe oge gara aga kpatara na ụfọdụ ndị mmadụ etinyela ọnụ ịchọ ya bụ ihe. Mana kedụ ihe 'Restructuring' pụtara nhazigharị n'asụsụ Igbo a na-ekwu maka ya? Ọkammụta Uche Aja kọwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ iwere ike dị n'etiti nye mpaghara dị ịche iche ka ha nwe ike chịa onwe ha ma nwe ikikere ịhazị mpaghara ha. Onyeisiala Naịjirịa dị Igbo nso karịa 'restructuring'- Osita Okechukwu Ihe Obi Onicha kwuru maka 'restructuring' O kwuru na nke apụtaghị n'obodo ga-ekewa kama na ọ ga-enye ohere mpaghara ọbụla igbo mkpa dịrị ha onwe ha. N'ọnụ ya, "Nhazi obodo etu a bụ ihe ga-azọpụta Naịjirịa n'ọnọdụ a ọ dị" Ndị tinyere ọnụ n'okwu a 1. Obi n'achị Ọnịcha Nke mere nso nso a bụ na Obi na-achị Ọnịcha bụ Igwe Alfred Achebe kwuru na ya bụ nhazigharị obodo dị mkpa. O kwuru na nke a ga-aka baa uru n'ihi na mpaghara niile kwesiri ị nwe ike ị nye onwe ha nrị n'adaberehe n'enyemaka gọọmentị etiti. Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a. 2. Ikenga Nnewi Mazi Dozie Ikedife ekwughi ma o kwenyere na ya bụ nhazigharị, mana o kwuru na a ga-agba mbọ kọwaa ya bụ okwu ọfụma tup o kwenye na ya. Gee ihe onyonyo a ka ịhụ ihe o kwuru n'uju. 3. Ohaneze NdịIgbo Nnia Nwodo malitere dịka onye ndu nke itoolu (9) ndị Ohaneze Ndigbo n'afọ 2017 Ọ bụghị taa ka ike nọ n'azụ ya bụ na ọ bụghị taa ka otu ohaneze ndị Igbo na-achọ ya bụ nhazi akpọrọ 'Restructuring' N'uche ha, ọ ga-enye ohere ka ndị mmadụ jiri ọnatarachi dị ha n'ime were rụpụta ihe ndị ga-abara ha uru. Ha kwenyekwara na ọ ga-enyeaka belata mmegbu a na-emegbu ndịIgbo na Naịjirịa. Gụọ ihe ha kwuru ebe a Ohaneze asaala Ipob 4. Chukwuemeka Ezeife Chukwuemeka Ezeife,onye Igbo-Ukwu bụbu gọvanọ na Anambara Steeti bụ otu n'ime ndị kwadoro 'restructuring' Onyebụbu gọvanọ Anambara steeti bụ Chukwuemeka Ezeife sonyere kwado ihazigharị Naijiria na mpaghara. Ezeife sịrị na ọ ga-ewelite mpaghara ọwụwa-anyanwụ ma weghachie ya etu ọ dị tupu afọ 1954 oge mpaghara ọbụla na-agbara onwe ha mbọ. 5. Atiku Abubakar Onye ndọrọndọrọ ọchịchị chịburu Naịjirịa dịka osote onyeisiala kwuru na oge eruwo a ga-eji hazị obodo Naịjirịa n'ụzọ mpaghara dị icheiche. O kwuru na ihe nhazi ga-ebute bụ ọchịchị ziri ezi ga-emekwa ka udo dị na Naịjirịa pụta ọfụma maka na ndị mpaghara ọbụla ga-enwe okwu n'ihe gbasara obodo ha. O ji kwa ohere ahụ kwuo na gọọmentị kwesiri ị sepu aka n'ihe gbasara akụnaụba obodo. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ịha mmiri ọ bụ ihe na-eme n'ezie n'ala Igbo? Ụmụaka abụọ anwụọla n'Ebonyi maka kerosene adigboroja Ihe ị kwesiri ịma maka okpueze ala Igbo
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45374744
'Chukwu nyere anyị ejima nwoke anọ ka anyị chechara afọ 7'
Di na Nwunye mụru ejima anọ ekwuola etu Chukwu si nye ha ejima nwoke anọ ka afọ asaa gachara ha jị gbaa akwụkwọ.
2018-09-02T09:32:43Z
'Etu m jiri mụọ ejima anọ'
Ezinaulo Peter na Amuche Ejiofor agwaala BBC Igbo etu ndị agbata obi ma ndị ulo ha ụfọdụ gbawara ha obi maka amụghị nwa ruo afọ asaa. Odoziaku Amuche kwuru na otu nwunye di ya kọrọ ya ezigbo ọnụ n'ọnwa Eprelu 2017. Ọ dị ime n'ọnwa May nke afọ ahụ. Ha kwuru na Chukwu nyere ha ụmụ ejima nwoke anọ n'otu ọmụmụ. Ha kpekwara ndị nọ n'ọnọdụ a ekpere puru iche,
[ "Ezinụlọ", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45388647
Ụlọuka Katọlik adagbuola nwata na Delta steeti
Nwata di afọ nwụru ka ọtụtu mmadu merụrụ ahụ mgbe ụlọụka daara n'ụtụtụ a ka a na-aka ụkọ taa.
2018-09-02T13:32:47Z
Ụlọuka Katọlik daara na Delta akụgbụọla otu nwata
Ụlọ dara ada. Otu nwata dị afọ 11 anwụọla oge otu ụlọụka akpọrọ St. Paul Catholic Church, Ugolo dị n'obodo Okpe n'ime Delta steeti dara ebe a na-eme ekpere n'ụtụtụ taa. Ihe mberede a mere n'elekere itoolu nke ụtụtụ a ka ndị mmadụ nọ n'ime ụlọụka ahụ na-ekpe ekpere. Anyị dọpụtara ụfọdụ mmadụ ebe ụlọ ha dagidere ha- Waziri Ụmụaka isii adabala n'ime olulu nsi Onyeisi ndị uweojii nke steeti ahụ bụ Mohammed Mustapha gwara BBC Igbo na ụlọụka kara ezigbo nka nakwa na ha eburola ndị pụtara na ndụ n'ihe mberede a gawa ụlọọgwụ. O kwuru na ugbua ọnaghị enwe ike ikwu ihe mere ụlọ a jiri daa, mana ọ na-eche na ọ bụ maka oteela ha lụrụ ụlọụka a. N'ọnụ okwu ya: "Ụlọụka a dị afọ 100. Ọ bụ ụlọụka a lụrụ oge ndị ọcha na-achị ala anyị. Ihe a bụ ihe m che mere ka ụlọụka daa mana anyị ka na-eleba anya na mberede a. Onyeisi ndị sineti Naijirịa bụ Bukola Saraki etinyela ọnụ zigara ndị ihe mberede metụtara ozi itiakab'obi site n'akara soshal midia ya taa. N'ime ozi ahụ o gwara aka n'achị Delta steeti bụ Ifeanyi Okowa ha dibe ma kwu kwa na ya jisike enweta enyemaka ebe ha nọ N'ọnụ "anyị ga-agba mbọ ị hụ na ndị ji ndị ha pụta n'ihe a ga-enweta ọgwụgwọ kwesiri ha". Akụkọ ndị ga-amasị gị: AMVCA 2018: Lee etu ndị Igbo si pụta n'ọgbọ Lee ka e si eri ji ọhụrụ n'Alaigbo Ebuka n'uwe ya esunyela ọkụ na soshal midia ọzọ
[ "Delta Steeti", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45387557
CAF amapụla ndị ọgba bọọlụ abụọ mba Naịjirịa
Amapụla ndị ọgba bọọlụ Naịjirịa abụọ dịka e mechara nyocha afọ ha dị ebe onyeisiala Buhari na ndị Naịjirịa bi China nwere nzụkọ.
2018-09-02T18:32:23Z
Akụkọ kachasị mkpa taa: CAF amapụla ndị ọgba bọọlụ abụọ
N'egwuregwu, Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọolụ na Africa amapụla ndị ọgbabọọlụ Naịjirịa abụọ n'isonye n'asọmpị nke U-17 a ga agba na Niamey maka afọ ha dị karịrị iri na asaa. Naijiria na BurkinaFaso ga-asọmpị echi n'elekere anọ iji mata onye ga-etozu ị ga asọmpị AFCON. Na Delta steeti taa, Otu mmadụ anwụọla mmadụ anọ meruru ahụ ebe ụfọdụ ka tọrọ n'okpuru ụlọụka dasara ndị mmadụ ebe ha na-aka ụka ụtụtụ na Deta steeti. Onyeisi ụlọomeiwu ukwu Bukola Sararki ekwuola na ya ga-enyeaka chọpụta ma gwọọ ndị pụtara n'ihe a. Ọzọ, Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị Naịjirịa na mba China enweela nzụkọ na mkparịta ụka ụnya ahụ dịka ọ gara mba ahụ. Na nzụkọ ahụ o kwuru na ụjọ anaghị atụ ya gbasara ntuliaka kwụọtọ na 2019 maka na ọ bụ ihe oji banye ọchịchị . Na mba ofesi, Ihe karịrị mmadụ puku iri emela ngagharị iwe n'ihi oge ezumike nka na mba Rọshịa. Gọọmentị mba ahụ na-akwado ịme oge ezumike nka afọ iri isii n'atọ maka ụmụnwaanyị na afọ iri iss n'ise maka ụmụnwoke. N'ụtụtụ AMVCA kpọpụtara ndị ụlọ fiim ụnyaahụ Ndị ihe nkiri si Naijirịa na mba ndị ọzọ n'Afrịka gbakọrọ na Legọs unyaahụ maka emume akpọrọ Africa Magic Viewers Choice Awards. Emume nke afọ a bụ nke isii kemgbe ebidoro ịtụ ndị ihe nkiri ugo site na atụmatụ a. Ndi ihe nkiri zuru ka emee na ya bụ emume ebe ndị tụrụ ugo dika Adekola Odunlade, Omotola Jolade, Nyce Wanueri na ndị ọzọ. Aka m adịghị ya! - Rotimi Amaechi Rotimi Amaechi bụ onye chiburu Rivers steet kwuru na ọbụghị eziokwu na ọ họpụtara onye ga-azọ ọkwa gọvanọ n'APC n'ime Rivers Steeti. Akụkọ na-ekwu na ọ họpụtara Tonye Cole bụ onye ojiegoachọego ama ama, mana Amaechi kwuru na ọ bụ ndị iro na-ekesa akụkọ a. Boko Haram egbughi ndị otu anyị -Naịagha Naịjirịa Lee ka e si eri ji ọhụrụ n'Alaigbo Nd agha Naịjirịa agọọla ebubo Ndịagha Naịjirịa na-ekwu na akụkọ ndị ntaakụkọ AFP dere na ndị Boko Haram gbagburu ndị agha Naịjirịa n'ụbọchị ole ole gara aga abụghị eziokwu. Ndị agha kwuru na ọ bụ ndị otu ha gbagburu ọtụtụ n'ime ndị agha Boko Haram. AFP dere na ndị Boko wakporo ndịagha Naịjirịa n'obodo Zari n'ime Borno steeti, nakwa gbuo ndị agha ruru iri atọ. US esepụọla aka enyemaka na Palistine Na mba ofesi, goomentị Amerika ekwuola na ha ga-akwụsị ịnye ego enyemaka ha na-enye ndị Palistine. Amerika kwuru na ha ga-akwụsị ịkwụ ego a ruru nde dọla narị atọ makana Palistine ka na-anabata ọtụtụ ndị agha iyi egwu n'ala ha. Gee akụkọ anyị n'ụtụtụ a Lee ihe nkiri anyị
[ "Boko Haram", "Ịkpa obi aṅụrị", "Ihe nkiri", "Naijiria", "Donald Trump" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45393826
Bịanụ rụọ ọdọ ụgbọelu Enugwu - Gọvano ndị ọwụwa anyanwụ
Aka ndị na-achị steeti ndị ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa sị na ọrụ ọdọ ụgbọelu enugwu bụ ihe gọọmentị kwesịrị iwe ka ihe dị mkpa.
2018-09-03T06:32:23Z
Ọdọ ụgbọelu Enugu: Gọvanọ ndị ọwụwa-anyanwụ sị na ọnọdụ ya na-agbawa obi
Ọdọ ụgbọelu nke Enugwu A ka na-arụ ọrụ n'ọdọ ụgbọelu nke Enugwu Gọvanọ ndị si mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa na-akwa arịrị maka ọnọdụ ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'enugwu nọ na ya ugbua. N'ọgbakọ ha mere n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Septemba 2018, ha kelere gọọmentị etiti maka itinyebụ ya aka, ma kpọkuo mịnịsta na-ahụ maka ụgbọelu ka ha bịa lee ọdọ ụgbọelu ahụ anya ma mezie ihe ndị e kwesịrị imezi na ya. Ihe ihere ji kwesị ime ndi omeiwu Igbo: Chekwas Okorie Bọjetị 2018: 'Buhari chọro iji ihe a ghọgbuo ndị Igbo' Gịnị mere Jim Iyke ji ewu na soshal midia? Onye nọ n'isi oche nzukọ ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Davịd Umahi, bụkwa aka na-achị Ebonyi steeti, kwuru ihe a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ ihe pụtara na nzukọ a ha mere. Umahi sị na ọ dị mkpa ka e mezie ebe a na-anabata ngwaahịa na ya bu ọdọ ụgbọelu. Ọdọ ụgbọelu nke Enugwu so na ọdọ ụgbọelu nke ụgbọelu si mba ofesi na-ada, mana o nwebeghi ọtụtụ ihe o kwesiri inwe, dịka ọkụ okporo ya, nke ga-eme ka ụgbọelu daa n'abalị. Na bọọjetị nke 2018, a mapụtara nde naịra narị ise maka ọrụ ọdọ ụgbọelu a. Cheta na omeiwu Ike Ekweremadu, bụ osote onyeisi ndịomeiwu ukwu Naịjirịa na ndị omeiwu ọzọ si ọwụwa-anyanwụ, tinyere ọnụ n'ebubo onyeisiala Muhammadu Buhari boro ndị omeiwu na ha chabiri ego e kwesịrị iji rụọ ọrụ n'akwa Naịja nke abụọ, ọdọ ụgbọelu dị n'Enugwu, ụzọ Benin-Ọre nakwa ọtụtụ ọru ndị ọzọ ga-abara ndị Naịjirịa uru ma were ego tinye n'ebe ọzọ. Na nkọwa ya, Ekweremadu kwuru na uche ya na nke ndịomeiwu si ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa dị n'ọdọ ụgbọelu Enugwu so n'ọrụ dị icheiche ndịomeiwu chabiri ego ya. Ekweremadu kwuru na ọ bụ na ngalaba omeiwu a na-akpọ "committee" n'asụsụ Bekee ka nchabi a mere, ma kwuo na ndị Kọmiti o metụtara gaha agwa ọha ihe mere na etu o siri mee. Akụkọ ndị ga-amasị gị: CAF amapụla ndị ọgba bọọlụ abụọ mba Naịjirịa Ụlọuka Katọlik adagbuola nwata na Delta steeti Boko Haram egbughi ndị otu anyị -Ndịagha Naịjirịa
[ "Ịji ego achụ ego", "Njem ụgbọelu", "Njem", "Njem", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45397445
Lee ihe iri bụ arụ ma nwaanyị Igbo mee ya
Nwaanyị na nwoke ahaghị nhatanha n'ala Igbo nke mere ka e nwee ihe ndị iwu machiri nwaanyị ime.
2018-09-04T10:06:14Z
Ihe Igbo sọrọ nwaanyị ime
Nwoke na-eche ibe ya ọjị N'omenaala Igbo, nwoke na nwaanyị ahaghị aha n'anya. A na-agbado ụkwụ ma mmadụ abụ nwoke maọbụ nwaanyị n'ike ọrụ maọbụ oke dịrị onye. Ihe ị kwesiri ịma maka okpueze ala Igbo Ihe asaa nwoke Igbo chọrọ na nwaanyị ọ ga-alụ Ihe iri agboghọ ugbua chọrọ na nwoke ga-alụ ya Nwoke a ga-azanwu aha nna nwunye ya n'ala Igbo? Ụmụnwoke n'agbanyeghị ma ha abụ nwata, karịrị nwaanyị n'ọkwa na ngụkọ dịka omenaala Igbo si dịrị. Ya mere, o nwere ọrụ maọbụ ohere a mabidoro na nwaanyị enweghị ikike ya nke bụ na nwaanyị nupuru isi n'ihe ndị a 'mere arụ'. Lee ụfọdụ n'ime ihe ndị nwaanyị anaghị eme: 1.Nwaanyị anaghị arị maọbụ ete nkwụ Nwaanyị anaghị arị nkwụ n'ala Igbo N'ala Igbo, nwaanyị anaghị arị elu nkwụ, elu ọjị maọbụ ọjịị. Ngawuchu kwuru na nwaanyị anaghị arị nkwụ n'ihi na nwaanyị esighị ike. "O nwere ike rịa elu nkwụ, hụ agwọ, egwu ejide ya, ọ daa n'elu." N'okwu ọkammụta asụsụ Igbo na Mahadum Legọs (University of Lagos) bụ Chigozie Nnabuihe, ọ bụ iji chekwa ugwu nwaanyị. Nnabuihe kọwara na oge gboo, nwaanyị anaghị eyi akwa na-awachi ahụ nwaanyị nke mere na ọ rịa elu, onye nọ n'ala ga-ahụ ọtọ ya. 2. Nwaanyị anaghị eketa ala obi Nwaanyị nwere ike inweta ebe ịkọ ubi mana ọ gaghị enwe ikike ire ya maọbụ nye onye ọzọ N'ala Igbo, nwaanyị anaghị eketa ala obi. Nkwenye Ndigbo dịka otu okenye, Chukwudi Nganwuchu, siri kọwa bụ na nwaanyị nwere oke naanị na be di ya. Mana n'ezie, nwaanyị anaghị enweta oke na be di ya ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwoke. O nwere ike e nye nwaanyị ebe ịkọ ọrụụgbo mana ọ bụghị nke ya n'ezie n'ihi na onweghị ikike ire ya maọbụ inye ya onye ọzọ. 3. Nwaanyị anaghị edu ụmụnwoke, ọ naghị aga agha Nwoke ka ọ dịrị iga agha n'ala Igbo Nwaanyị anaghị edu ụmụnwoke n'ọgbakọ maọbụ n'agha. Na nkọwa ya, Ọkammụta Nnabuhe sị "O bụ nwoke ka ọ dịrị ichekwa ezinaụlọ ya. Ọ bụ ụmụnwoke ka ọ dịrị ichekwa obodo." 4. Nwaanyị anaghị awa ọjị Nwaanyị anaghị awa ọjị ebe nwoke nọ. Ọ bụ naanị oge ụmụnwaanyị gbakọrọ naanị ha ka onye kachasị okenye n'ime ha nwere ike ịwa ọjị mana ọgaghị agọ ya agọ. Dịka Nnabuihe kwuru, ihe kpatara na nwaanyị anaghị agọ ọjị bụ na ọjị bụ ihe dị nsọ, nwaanyị nwere oge ọ na-anọ na nso; ọ ga-emerụ ọjị. 5. Nwaanyị anaghị ekenye nwa di Nwanyị anaghị anọ ebe a na-ekwu akụ nwaanyị ọ masị ya, ya bụrụ na di ya anwụọla. Nnabụihe sị "Ọ bụ iji gosi na ọbụghị anụmanụ ka a na-azụ, ọ bụ mmadụ ka a na-alụrụ. Ọ bụ anụmanụ na-anọ ebe a na-ekwe ya ọnụ." 6. Nwaanyị anaghị ata eke ọkụkụ Nwaanyị ekwesighị iri eke ọkụkọ dịka omenaala Igbo siri dị Otu okenye aha ya bụ Chukwudi Nganwuchu gwara BBC Igbo na ihe mere ndị gboo jiri machie nwaanyị ịta eke ọkụkọ bụ na e nwere nkwenye na eke ọkụkọ na-atọ ụtọ ebe ọ dị ukwu nke na 'nwaanyị tara ya ga-ebido gbawa n'ezi.' Nnabuihe kwuru sị, "Eke ọkụkọ bụ nke nwoke. Akpụrụotule bụ nke ya, isi ya nke diọkpara. Ada nwe ukwu ya. agba dịkwara ada." 7. Nwaanyị nọ na nsọ anaghị esiri onye chiri echichi n'ala Igbo, nri. Ọ bụrụgodu na di ya bụ onye chiri ọzọ, ọ gaghị eri nri nwaanyị ma ọ nọrọ na nsọ. Nnabụihe sị, "Onye chiri echichi bụ onye dị nsọ. Ọ bụrụ na o rie nri nwaanyị nọ na nsọ o merụọ nsọ ya." 8. Nwaanyị anaghị alụ nwoke Nwaanyị enweghị ike lụọ nwoke etu nwoke si aga alụ nwaanyị. 9. N'ekele, nwaanyị anaghị eri aka atọ N'ekele, nwaanyị anaghị ana aka Nwaanyị anaghị eri aka atọ maọbụ kwuo 'Igbo kwenu', 'Ndigbo mmammanụ o'. "Nwaanyị nwere ike ikwu, "Ndị di m ekele m ụnụ o!'" "Ọ bụghị nwoke niile na-ana aka atọ. Ọ bụ nwaanyị chie elu chie ala, onweghị ike ana aka atọ, abụọ maọbụ otu." 10. Nwaanyị anaghị aṅụ ike nkwụ Nwaanyị anaghị aṅụ ike nkwu Agaghị agụchali ihe nwaanyị agaghị emenwu n'ala Igbo mana ọ dị mkpa ma ị mara na ihe ị na-eleda anya na ọbụghị ihe bụ nso: Nwaanyị ekwesịghị ịnụ ike nkwụ n'omenala Igbo. Nnabuihe sị, "Ọ bụ ihe na-enye nwoke ike ọ ga-eji rụọ ọrụ dịrị ya." Na nkọwa ya, o kwuru na ọbụghị mmegbu kpatara ndị gboo ji nwee iwu ndị a niile kama na onye ọbụla ma nwoke, nwaanyị na ụmụaka nwere ọrụ ya n'ala Igbo. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Akụkọ dị mkpa taa: China chọrọ inye Naịjirịa $60b Unu egela Ipob ntị - Ndị ọrụ nchekwa 'Ihe mere anyị ji kwe ka Davido gaa njem' Shekarau gbababuru PDP agbapụla
[ "Naijiria", "Omenala", "Ikike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45417837
Onye nkuzi Super Eagles nara aka azụ $1000 ga-akwụ $5000
Cheta na BBC wepụtara ihe nkiri gosiri na o nwere ike na-ana aka azụ tupu ọ họrọ ndị ga-agba bọọlụ.
2018-09-05T07:32:42Z
Salisu Yusuf nara aka azụ $1000 ga-akwụ nha $5000
Salisu Yusuf Salisu Yusuf kpọ ndị Super Eagles na-agba n'ụlọ gaa asọmpi CHAN n'afọ 2017 ebe ha ruru agba ngwụcha Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọolụ na Naịjirịa bụ Nigerian Football Federation (NFF) dara Salisu Yusuf nha $5000 ka a chọpụtara na ọ na-ana aka azụ n'isi ndị ọgba bọọlụ. NFF nyere iwu sị ka Yusuf sepụ aka n'ihe niile gbasara egwuregwu bọọlụ n'ime otu afọ. Na-erughị ọnwa ole na ole gara aga, BBC African Eye wepụtara ihe nkiri otu onye ntaakụkọ Ghana bụ Anas Arameyaw Anas, sere na nzuzo gosiri ka Yusuf na-ana 'onyinye' puku dọla ($1000), iji hụ na ọ kpọrọla ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ gaa asọmpi mpaghara Afrịka nke 2017. Ihe onyonyo egosila onye nchịkọta bọọlụ Naịjirịa ka ọ naara ego Onye nchịkọta bọọlụ Salisu Yusuf dịka ọ na-anara ego NFF kwuru na Yusuf ji anya ọcha ya nara ego ahụ; na omume ya mechuru ngalaba ha ihu makana o kwesịrị ịkpazi agwa ọfụma, ọkachasị maka aka o binyere n'akwụkwọ usoro akparamagwa nke dị n'akwụkwọ nkwenye e ji wee ya n'ọrụ. Ha kwukwara na mmadụ abụọ e ji megharịa ya anya na a chọrọ ka ọ họrọ bụ Osas Okoro na Rabiu Ali, gaara esonyekwa ndị otu ha gaa ya bụ asọmpi n'agbanyeghi ego ahụ Yusuf narala, maka "ọnatarachi na ịgba ọfụma ha". N'akwụkwọ ndepụta ha wepụtara, NFF kwuru na ọ ga-akwụ nha puku dọla ise a dara ya tupu ọnwa atọ agachaa. Colins Udoh bụbu ọnụ na-ekwuchitere ndị Super Eagles tinyere ọnụ n'okwu a na Twitter. Akụkọ ndị ga-amasị gị: China chọrọ inye Naịjirịa $60b Unu egela Ipob ntị - Ndị ọrụ nchekwa Lee ihe iri bụ arụ ma nwaanyị Igbo mee ya Onye chọrọ ịzọ ọchịchị n'APC ga-akwụ nde 45
[ "Egwuruegwu", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45444388
Akụkọ dị mkpa taa: Tọghapụ Elzakzaky - Shiite
Ndị otu Shiite akpọọla oku ka ndị DSS tọhapụ onyeisi ha bụ Elzakzaky n'emume ncheta ụbọchi otu puku ọ nọrọla n'aka ha.
2018-09-07T18:09:54Z
#FreeZakzaky: Elzakzaky anọọla abalị 1000 n'aka ndị DSS
Akụkọ dị mkpa taa: Tọghapụ Elzakzaky Sheikh Ibrahim Zakzaky Ndị nkwado onyeisi ndị Shiite bụ Ibrahim Elzakzaky pụtara n'igwe n'okporoụzọ Abuja taa, na-akpọ oku ka atọhapụ ya dịka ha na-echeta ụbọchị otu puku ọ nọọrọla n'ọnya ndị DSS. Anwụchiri Elzakzaky kamgbe afọ 2015 dịka eboro ya ebubo na ogburu ndị agha bụ nke ikpe ya ga-abụ ọnwụ. El-Zakzaky: Ihe mere ndị Shi'ite jiri gbuo onye uweojii na Kadụna Ọ bụghị Alaọmajiji mere n'Abuja - FEMA Ụlọọrụ gbatagbata nke Abụja bụ FEMA akatọọla akụkọ na-ekwu na alaọmajijiji mere n'Abuja. FEMA kwuru na ọ bụghị alaọmajijiji kama na ọ bụ mgbawa okwute nakwa ọrụ ndị na-egwupụta ihe n'ala kpatara nke a. Onye ụkọchukwu a onwere ọdaeshi? Otu ụkọchukwu akpọrọ David Chidiebere kwuru na ya gbanahụrụ ọnwụ mgbe ndị ojiegbe wakporo ụgbọala ya ma wụkwasị ya egbe mana mgbọ egbe atụghị ya n'ahụ. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed sị na Chidiebere gwara ya na nke a mere n'ụzọ si Udi gawa Enugwu. Akụkọ si mba ofesi Onyeisi ụlọọrụ ụgbọelu mba Briten arịọla ndị na-eji ụgbọelu ha eme njem mgbaghara maka mwakpo ndị na-eji igwe Kọmputa ezuohi mere ụlọọrụ ahụ bụ nke metụtara ọbaego ndị ahụ. N'egwuregwu Otu egwuregwu Manchester United akwụsịla mkparịta ụka maka ọdịnihu ha na onye otu ha bụ Paul Pogba kwuo na odochaghị anya ma nwamadị ahụ ọ ka chọrọ ịgbara ha bọọlụ. Cheta na akụkọ na-ekwu na Pogba nwereike ị hapụ Manchester United gawa Barcelona n'ọnwa Jenụwarị nke afọ na-abịa abịa. Nkeji nke abalịa Iwu ntuliaka 2019 Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-anọghị na gọomentị ekwuputala ụjọ ha na 2019 agaghị aga n'ụzọ ziri ezi etu o kwesịrị. Ụjọ ha bụ na Onyeisiala Muhammadu Buhari jụrụ ikwenye ka a gbanwee iwu ntuliaka nke 2019, dịka ha na-ekwu ka ndị ụlọomeiwu etiti gbaa mbọ kuziere ndị Naịjirịa ihe gbasara iwu a. Uweojii nke steeti Ọkaiwu a ma ama na Naịjirịa bụ Femi Falana ekwuola na nhazighari e mere SARS agaghị egbo nsogbu ọrụ ndị uweojii na nchekwa Naijiria. Falana, onye kwuru na mkparịtaụka o nwere na Channels TV ụnyaahụ ka e nwee ndị uweojii nke steeti sịrị na o nweghị mba a na-enwe naanị ndị uweojii etiti. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: '#FSARS asaghị nsogbu ịhazịgharị ọrụ nchekwa ndị uweojii' Na mba ofesi, Ndị obodo Idlib na-eji akụrụngwa awarawa ekpuchi imi ka ha na-atụ anya mwakpo kemịkal a Amerịka ekwuola na ha nwere ọtụtụ ihe akaebe doro anya na-egosi na gọomentị Syria na-akwado ịtụpụta ngwaagha kemịkal n'obodo Idlib. N'egwuregwu, Serena Williams gosiri na ọ kajara akaja dịka ọ pịapụrụ Anastija Sevastova n'ọkara-Ikpeazụ nke asọmpi US Open. Serena ga-ezute Naomi Osaka n'agba ikpeazụ, ebe ọ ga-abụ o merie, o rite nzere 'Grand Slam' nke iri abụọ na anọ ya. Nkeji taa Ihe nkiri ga-amasị gị Eunice Atuejide na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019 apụtala ịkọwa ọnọdụ ya gbasara okwu 'Feminist' o kwuru wuru ewu na soshal midia.
[ "Shia Islam", "Islam", "United Kingdom", "Naijiria", "Egwuruegwu", "Muslims", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Alaọmajijiji", "Abuja", "Mberede njem ụgbọelu" ]
https://www.bbc.com/igbo/45457782
Ụmụ Naịjirịa achịpụtala Buhari ụkwụ n'ama
Obi adịghị ụmụ Naịjirịa mma maka ego onyeisiala Muhammadu Buhari bitere na China nke na ha na-adọkasị ya na soshal midia.
2018-09-08T07:52:08Z
Africa-China Cooperation: Ụmụ Naịjirịa achịpụtala Buhari ụkwụ n'ama
Ọgbakọ ndị Naịjirịa na China Ụmụ Naịjirịa agala n'elu soshal midia ikwupụta ebumnobi ha nye onyeisiala Muhammadu Buhari maka ego o bitere na mba China dịka o mere njem gaa ebe ahụ n'izuụka a. Buhari gara China maka ọgbakọ mmekọrita China na mpaghara Afrịka nke a kpọrọ 2018 China Beijing Summit of the Forum on Africa-China Cooperation na Bekee. Buhari bitere ego ruru nde dọla 328 n'aka ndị China mana ụmụ Naịjirịa anabataghị ya. Onyeisiala Buhari ekelela onyeisiala China Kedụ ihe Afrịka ji agbaga China? Africa Free Trade Agreement: Ihe ise ị kwesiri ịmata N'elu Twitter, ha mapụtara n'ike na ebube na-agwa Buhari etu ọ dị ha n'obi. Idama mere mgbakọ na mwepụ banyere ya bụ ego ma kwuo na ihe ọ pụtara bụ na ndị Naịjirịa niile ji China ụgwọ puku naịra iri na ise (15,000) na otu na otu. N'akụkụ nke ya, Olanrewaju Olumoh kwuru na ụgwọ Naịjirịa ji akarịala akarị gụnyere ego nke a o bitere ọhụrụ. Abrahama MUFC na-ajụ etu Naịjirịa ga-esi kwughachi ego niile ha na-ebite China ka China ghara ịbịa were ala Naịjirịa na nkwughachi. Darius kwuru na ntọala a Buhari tọrọ abụghị nke ọma ya ebe Crowned Emmanuel na-ekpe ekpere ka Buhari nọrọ ndụ ka a kwụsịa ụgwọ niile a. Mana Mayowa Adeleye na-ajụ ka a kọwara ya etu gọomenti Buhari bụ ndị kwekọrịtara ka e kee ego Abacha zuru bụ nde dọla 322 mechara gaa bite nde dọla 328 na China. Ụfọdụ kwadoro ihe Buhari mere Agbanyeghị nkatọ niile ahụ, ụfọdụ na-ekwukwa na ihe onyeisiala mere bụ maka ọdịmma obodo. Comrade Abubakar kwuru na ego ndị China dị ọnụala ịkwụghachi, ma kwuo ka Naịjirịa gaa n'ihu bite iji kwalite obodo. N'akụkụ nke ya, Yaqoob Qaseem kwuru na ọ ga-abụ ezi njehie ma ụmụ Naịjirịa wepụ Buhari na ntuliaka 2019 maka na ya nwere ntụkwasị obi ebe ọ nụ. Onyeisiala Buhari kwuru na ego ahụ e bitere China bụ iji kwalite ngalaba teknụzụ Naịjirịa. Mana egwu na-atụ ụmụ Naịjirịa na ọ bụrụ na a kwụghachighị ego ahụ, China ga-abịa were ọtụtụ akụnaụba Naịjirịa dịka nke ha etu ha si eme na Zambia ugbua. Kama onyeisiala agwala ha nwee olileanya na ntụkwasịobi na azụmahịa ha ji ego ahụ eme ga ebido ritewe elele. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ụlọikpe atụọla ndị Boko Haram 113 mkpọrọ Ncheta mbido Agha Biafra Gịnị ka ị kwesiri ima tupu ị nabata onye odibo
[ "Naijiria", "China", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ahịa", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45503805
Ọkụ latrik abụghị ihe e ji achụnta vootu - Ezeh
Onyeisi mgbasa ozi ndị ụlọọrụ Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) bụ Emeka Ezeh kwuru na ọ dịghị mma ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị were ọkụ latrik na-achụ nta vootu.
2018-09-12T18:13:35Z
EEDC: Gọọmentị anaghị emezu nkwa ha kwere
N'okwu gọọmentị na-achị ugbua kwuru na ọkụ latrik ga na-enwu kwa mgbe ma ọ bụrụ na-atụnyere onyeisiala Buhari n'afọ 2019. BBC Igbo jụrụ onyeisi mgbasa ozi Enugu Electricity Distribution Company bụ Emeka Ezeh ajụjụ gbasara nke a. O kwuru na ọbụghị naanị ihe a na-ekweta na nkwa kama na ọ bụ site n'ịrụ ọrụ so ya n'azụ. Ọ kwuru na ihe gbasara ọkụ latrik ekwesighi ịbụ ihe eji achụnta vootu dịka gọọmentị nakwa ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ji ya eme ugbua. Ezeh gara n'ihu kwuo na gọọmentị anaghị emezu nkwa ha kwerela n'isi ọkụ latrik kamgbe ha bara ọchịchị.
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Enugwu", "Ike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45505883
2019: Economist, HSBC na-akọ ajambene-APC
Otu pati APC akatọọla ụlọọrụ akụkọ Economist na ụlọakụ ọkaibe HSBC maka ihe ha kwuru banyere akụnaụba Naijiria na ntuliaka 2019 na-abịa.
2018-09-13T05:44:59Z
2019 Election: Economist, HSBC na-akọ ajambene-APC
One na-ere foto Buhari na ọkọlọtọ APC Onyeisiala Muhammadu Buhari nwetara nkwado otu pati ya Bụ APC ịzọ ọkwa onyeisiala ọzọ na ntuliaka 2019 Otu APC kwuru na amụma ụlọọrụ abụọ ndị nke sị mba Briten pụta na-ebu bụ amụma ụgha nke enweghị eziokwu dị ya. Ngalaba nchọpụta nke ụlọọrụ akụkọ Economist a kpọrọ 'The Economist Intelligence Unit, ' na bekee, kwụrụ na APC agaghị emeri na ntuliaka 2019, ebe HSBC buru amụma na akụnaụba Naijiria ga-akụ afọ n'ala ma ọ bụrụ na onyeisiala Nigeria bụ Muhammadụ Buhari merie na ntuliaka 2019. Gbasaanụ ozi kwụọtọ -Buhari Ntorobịa Naịjirịa amaala Buhari aka N'ozi nke odeakwụkwọ mgbasaozi otu ahụ bụ Yekini Nabena binyere aka, APC gwara ụmụ Naijiria ka ha ghara ịkpọ ozi ahụ si n'aka ụlọọrụ abụọ a okwu dịka ha kwuru na ọ bụ ụdị amụma ụgha a na-amabu nke na anaghị emezu. "Anyị ga-echeta na a maburu amụma na Naijiria ga-ekposa n'afọ 2015, ebe agburu dị iche iche ga agawara onwe ha. Nke a bụ afọ anọ ya ha buru amụma ụgha ahụ, kama Naijiria ikposa, ọ na-esiwanye ike dịka onyeisiala Buhari na-agba mbọ ijikọ obodo anyị ọnụ." Ha gara n'ihu kwuo na ọ na-agba pati ha gharịị ihe mere n'ụlọọrụ abụọ ahụ ahụghị ihe ọma niile ọchịchị APC merela na-ibua agha megide nrụrụaka, ọrụ mmepe na ibụ agha megide iyi-egwu. APC rụtụrụ aka na ego niile EFCC nwenitara n'aka ndị zuru ego Naijiria, mgbalite ego JAMB nakwa ụlọọrụ na-anata ụtụisi. Pati ahụ kwuru na kama ịja ọchịchị APC ike maa sonye na mgbasa ozi ka anata ndị buru ego ha ji, na ụlọọrụ abụọ na-akọ nke abụghị ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Achịcha Bekee: A ga-ebuli ọnụ ego ya? Beverly Osu o mere ihe ọjọọ iyi uwe ndị Katọlik? George Weah emeela ihe o jiri bụrụ dike Onye bụ Charles Ogbu m ga-eji saa ya okwu? - Femi Adesina
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45542918
Ọkụ Ronaldo enwuwela na Juventus
Cristiano Ronaldo amalitekwala igosi nke ọ mara eme n'otu egwu bọọlụ ọhụrụ ya bụ Juventus.
2018-09-16T18:42:12Z
Cristiano Ronaldo akpawala ike na Juventus
Cristiano Ronaldo Juventus ji nde paụnd 99.2 zụta Ronaldo Nwa Pọtụgaal bụ Ronaldo agaala na mba Itali malite igosi ike ya ebe o nyere goolu mbụ ya na Serie A taa n'asọmpi Juventus na Sassuolo gbara. O nyere goolu mbụ ahụ na nkeji iri ise wee tụkwasịkwa ọzọ ka nkeji iri na ise gachara. Sassuolo mechara nye otu goolu n'oge a gbakwụnyere mana Juventus meriri ọkpụ abụọ a satara otu. Ronaldo adịla njikere ịgafe Juventus Ronaldo chọrọ ịzọ mma ihu ya Ị ma ihe Ronaldo jiri chịrị ọgbọ ugbua? Mmeri a bụ nke anọ Juventus na-enweta n'asọmpi anọ ha gbarala ka afọ a malitere. Ronaldo anọọla n'ama egwuregwu nkeji 320 tupu o nye goolu mbụ ya kamgbe e jiri ego nde paụnd 99.2 wee webata ya n'otu Juventus ahụ. Tupu a gbaa asọmpi ahụ, onye nkuzi Juventus bụ Massimilliano Allegri, kwuru na ọ naghị eche ya na Ronaldo enyebeghi goolu agbanyeghi na ọ nwaala ihe ruru ugboro 23 n'ime asọmpi atọ ha gbarala. N'okwu ya; "Anaghị m ele anya ka Ronaldo mee karịa ihe o mere n'asọmpi atọ gara aga. "Ana m eche na echi nwereike ịbụ ụbọchị ya." Ronaldo nyere goolu 44 n'otu Real Madrid n'agba asọmpi gara aga, gụnyere 15 o nyeburu n'asọmpi Champions League n'ụzọ inweta nturugo nke atọ n'otu ahịrị. Juventus na-achọzị ụzọ ibu iko Champions League nke ha na-enwetabeghi n'ihe ruru 20. Akụkọ ga-amasị gị Ihe mbere okporoụzọ n'Awgu atala isi mmadụ anọ Kedụ ihe i hụrụ na nrọ n'abalị pụtara? Kedụ ebe Kemi Adeosun nọ ugbua?
[ "Italy", "Egwuruegwu", "Juventus" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-45584731
Ị ma ego ole i ji gọọmentị n'ụgwọ ụtụisi?
"Nnukwu anụ kpata nnukwu nkụ, obere anụ akpata obere nkụ" ọ bụ ụzọ Andersen Tax kọwara e si agbakọ ụgwọ ụtụisi ruru onye.
2018-09-20T06:17:30Z
Ị ji gọomentị ego ụtụisi?
Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ụtụ isi n'ụzọ dị icheiche n'ala Naịjirịa apụtala ị kọwa etu ndị mmadụ ga-esi gbakọ ụgwọ ụtụisi. Ha kọwakwara etu ya bụ ụtụ isi siri baa uru nakwa ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na akwụkwọ ụtụ isi gị ezughi oke. Ihe onyonyo a gosikwara ihe dị iche n'etiti onye na-eri ụgwọ ọnwa nakwa onye na-azụ ahịa nọrọ onwe ya. Ọrụ si n'aka: Jessica Nwankwo
[ "Ego mmadụ", "Naijiria" ]