source
stringlengths
0
47
title
stringlengths
0
100
description
stringlengths
0
502
date
stringlengths
0
20
headline
stringlengths
0
113
content
stringlengths
0
9.43k
tags
sequence
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43579990
Ndị njem ụgbọelu atọla taa
Ndị njem ụgbọelu na Legọs jị ụkwụ gaa ọdọụgboelu n'ụtụtụ taa maka a kpọchiri ọtụtụ ụzọ na-eche ọbịbịa Buhari.
2018-03-29T11:53:06Z
Njem Buharị na Legọs: Ndị njem ụgbọelu tọrọ atọ na Legọs
Ndị njem Emechiri ụgbọala ịgba n'okporoụzọ ụfọdụ maka ọbịbịa onyeisiala Muhammadu Buhari na Lagos steeti Ọtụtụ ndị njem ụgbọelu ji ụkwụ gaa ibanye ụgbọelụ n'ụzụ ụtụtụ taa dịka e mechiri okporoụzọ na-aga ọdọụgbọelu nke ụlọ na nke mba ofesi na Legọs n'ụtụtụ taa. A na-ele anya na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-abịa isi obodo Legọs maka mmepe ọdọụgbọala, ga-erute n'ọdọụgbọelu ahụ n'elekere nke iri na otu nke ụtụtụ a. N'ihi mkpọchi akpochiri ọtụtụ ụzọ, ndị mmadụ ji kwu ga ihe karịrị nkeji iri atọ maọbụ otu elekere tupu ha eruo ebe ndị na-abanye ụgbọelụ na-anọ. Mmechị a nke bidoro ụnyaahụ, dịka ndị njem siri kwuo, mekwara na ndị sị mba ọzọ febata n'ọdọụgboelu Legọs na-eji ụkwụ ga ogologo ije tupu ha erute ebe ha ga-abanye ụgbọ ga-akwọga ha ebe ha na-aga. Ụfọdụ ndị mmadụ na-egosi iwe ha na mkpọchị akpọchiri ezi na ụzọ na Lagos maka ọbịbia onyeisiala n'elu igwe okwu, Twitter. Henry Okelue kwuru: "Aghọtaghị m ihe mere e jiri mechie Legos maka njem onyeisiala. O bi n'Abuja na-agagharị n'etiti anyị kwa oge ma onwebeghị oge emechiri ya ọbụladị otu ụbọchị." Inibehie Effiong kwuru : "E mechie Legos maka njem Buhari. Ndị amala enweghị ike ịgagharị. Egbosara njem ụgbọelụ. E kweghị ka ụgbọala ga n'okporo ụzọ banyere ọdọ ụgbọelu. E mechiri ọrụ ndọ ọrụ boyibo. Ma gị asị na isi dị ndị ndu anyị mma?" A na-ekwukwa na steeti Legọs ga-efu ihe ruru ijeri naịra 200 maka mmechi emechiri ahịa na ebe ndị ọzọ maka njem onyeisiala na-eme. Onyeisiala ga-anọ mkpụrụ ụbọchị abụọ na Legọs dịka ọ ga-emepe ọdọụgbọala a rụrụ ọhụụ na Legọs. Akụkọ ga-amasị gị: Kpọpụta Nnamdi Kanu ụbọchị ikpe ya Malala alghachila Pakistan nke mbụ Akụkọ kachasi taa: Naịjirịa na Serbia
[ "Legọsị", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43586565
Mmetọahụ: Ndị ntaakụkọ akpasuola mmadụ iwe
Ndị ntaakụkọ Uganda akpasuola ndị mmadụ iwe maka ihe ha kwuru gbasara inye ndị awakporo karama mmanya.
2018-03-29T18:31:23Z
Ụlọọrụ ntaakụkọ Uganda:Kọọ maka mwakpo emere gị ma nweta karama mmanya
DAILY MONITOR Ndị Daily Monitor arịọla ndị mmadụ mgbaghara maka ihe ha dere Ndị ntaakụkọ Daily Monitor dị na Uganda akpasuola ndị mmadụ iwe na soshal midịa maka ihe ha dere gbasara ụmụnwaanyị a wakporo n'ike. N'ihe ha dere, ha kwuru sị na nwaanyị ọbụla a wakporo n'ike ga-ezitera ha akụkọ ihe ọ gabigara, ga-enwe ohere ịnweta otu "karama mmanya dị oke ọnụahịa". Dịka ihe gọọmentị ndị Uganda depụtara n'afọ garaaga, a wakpooloa ihe karịrị otu n'ime ụmụnwaanyị ise ruru afọ 15 ruo 49. Mana Daily Monitor kwuru na akụkọ ọzọ e depụtara gosiri na ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị a wakporo karịrị etu ahụ. Dịka ha siri kwuo, o ruru pasentị 51 bụ ndị ga-enweta mmekpa ahụ n'aka ụmụnwoke ha na ha nwere mmekọ n'ime ndụ ha. Na mbido ọnwa Maachị a, ndị mmadụ tara otu onye omeiwu Uganda ezigbo ụta maka ihe o kwuru n'onyonyo sị "dịka nwoke ị bụ, ị kwesịrị ị na-eti nwunye gị ihe. "Ị kwesịrị ịmetụ ya nwaobere aka, tie ya ihe iji hazigharịa omume ya." Akụkọ ga-amasị gị Kedụ ihe mere Buhari ji bịa Legọs? Ndị njem ụgbọelu atọla taa Melaye chọrọ ịgba onyeisi uweojii akwụkwọ Kemgbe ndị mmadụ ji tinye ọnụ n'okwu a, ndị Daily Monitor arịọla mgbaghara maka 'nghọtaghie ọbụla' ihe ha dere buterela ndị mmadụ. Ha ehichapụkwala ihe ha dere n'igwe okwu, mana ọ kwụsịghị ụfọdụ ndị mmadụ ikwuputa iwe ha.
[ "Ịwakpo mmadu na-ike", "Uganda", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43597735
Ndị uka Kristi mere ncheta ọnwụ ya
Ọtụtụ ndị otu uka Kristi aputaala n'iro taa maka ị cheta ụbọchị akpọgburu Jeso.
2018-03-30T17:37:20Z
Mmemme Good Friday: Ndi uka ji ejije na egosiputa ọnwụ Jeso
Ndị ihe nkiri Good Friday Ndị ụka Kristi na-echeta ụbọchị akpọgburu Jeso taa N'ọtụtụ ụlọuka ha guzobere ihe ejije iji gosiputa ahụhụ Jeso tara tupu akpọgbue ya n'elu obe. Na Blessed Sacrament Parish dị na independence layout Enugu, ndị mmadụ zụkọtara n'igwe kpagharia were ejije ha mụrụ wee gosi ka ndị Jew na Pilate sịrị kpogbue Jeso n'obe. Akụkọ ga-amasị gị Etu esi mee ụka ọmụ taa Lee emume Tọọsde dị asọ A nwụchiela Bishọp ụka Katọlik maka imefu ego ụka Onye na-achịkọba ya bụ ngagharị nke obe ịkpeazụ tupu Easter na parish ahụ bụ Rev. Fr, Ogbozo gwara ndị otu Kristi ka ha nọrọ na nche oge niile ma hụ onwe ha n'anya dịka Jeso sịrị hụ ndị tụkwasara ya obi anya. Ndị uka Kristi n'ụbọchị Good Friday Ka emechara ngagharị nke obe ahụ, eme kwara mmemme isusu obe ọnụ nke na-egosiputa ọgbụgbandụ Jeso na ndị kwere na ya. Gud Fraịde bu nnukwu emume na-eweta Lent n'isi njedebe tupu Jeso ekulie n'ọnwụ n'ụbọchị Easter dika ka ndị otu Kristi sị kwenye. .
[ "Naijiria", "Ndị otu Kristi", "Ụka ndị Roman", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43608307
Uweojii n'Enugwu anakọsịala ndị mmadụ egbe
Egbe dịka Ak 47, Egbe pump akshun, pistol otu barrel na egbe Barrera so n'ime egbe di icheiche anapụrụ ndị mmadụ.
2018-04-01T05:11:38Z
Anyị ga-anakọsị mmadụ egbe niile - Komịshịọna uweojii
Danmallam Mohammed Kọmịshịọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed ekwuola na ndị uweojii na-ebuso ndị na-enupu isi n'iwu ọgwụ na steeti ahụ Iji rube isi na iwu inspector General nke ndị uwe ojii na Naijiria bụ Ibrahim Idris nyere, ndị uweojii n'Enugwu steeti ekpokotala egbe dị 148. Onye kọmịshịọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed gosiri ndị ntaakụkọ egbe nile ndị ahụ, nke okwuru na ha napụtara ndị mmadụ iji wee Chekwa ndụ na akụ na ụba. Egbe na ngwa ọgụ ndị ahụ gunyere; Ak 47 10, Egbe pump action 13, obere egbe nwere otu barrel 33, obere egbe nwere ọnụ abụọ 36, Egbe obere nwere ọnụ asatọ, revolver atọ, obere egbe Barrera 11, ogologo egbe otu barrel 18, ngwo ngwo egbe ndị ọzọ, nakwa mgbọ egbe mejuputara ọnụ ọgụgụ. Ụkọ ọrụ na-ebute nnupu isi n'iwu Kọmishịọna Danmallam kwuru na ihea bụ mmeri ha nwetara na-agba nke mbụ ha jiri bido ya bụ ịnapụ ndị mmadụ egbe dịka onye isi ha kpata kpata siri nye ha iwu. Otoro ọrụ gbanụ gbanụ nke ACP Frank Idu nọ n'isi ya ma gwa ha ka ha were ngwa ngwa nakọtasịa egbe nine ndị mmadụ ji. Ọ gwakwara ndị mmadụ ka ha jiri aka ha were egbe ha nwere n'ulo ha nyefee ndị uweojii ghara iche ka ewere aka ike bịa nara ha ya. Ya bụ ọrụ gbanụ a ka ndị uwe ojii n'Enugwu kwuru na ọga adị ire ruo mgbe ha nakọsịtachara ndị mmadu nkịtị egbe ha ji. Akụkọ ga-amasị gị: Ndị uka Kristi mere ncheta ọnwụ ya Warner ariọla mgbaghara Rọshia 2018: Agaghị enwe referii Briten,Naijiria Ihe asaa ị kwesiri ịma maka ịgwọ ụra
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-43575957
Ị ma etu esi agwọ abacha? Mụta ya ebe a
Abacha so na nri ndị Igbo na-ejighị egwu egwu, lee ụzọ pụrụiche esi agwọ ya ka ọ tọọ ụtọ.
2018-04-01T07:40:36Z
Ị ma agwọ abacha?
Abacha Abacha bụ nrị e jiri mara ndị Enugwu steetị Abacha bụ nrị na-amasị ndị mmadụ niile rịrị ya nke ukwuu. Nrị a sitere n'aka ndị Igbo, mana ọ bụ ndị Enugwu steeti ka e ji ya mara. A na-eji abacha kpọrọ nkụ maọbụ nke mmiri eme ya. Abacha a si n'akpụ. E sịchaa ya n'ọkụ, e be ya kịrịkịrị. Eme chaa, etinye akpụ a na mmịrị oyi, ebe ọ ga-adị chi wee foo. Asaachaa ya, agbaa ya n'anwụ maobụ ya etu a dịka ụdịrị nke akpọrọ abacha mmiri. Ị ma ihe ole na ole e ji ama ofe ndị Igbo? Lee nri di iche iche esi n'akpụ emepụta Abacha agwọrọagwọ anaghị afịa ahụ ị mụta. Lee ka esi eme ya (mana, amatakwa na obodo di icheiche nwere etu ha si eme nke ha). Ihe ị ga-eji agwọ ya: Mmanụ nri Ugba/Ukpaka Nnu Oporo akwọrọ akwọ Ose na yabasị Aṅara a sara asa/akwụkwọ aṅara e biri ebi (ma ị chọọ) Akwụkwọ ụtazị e biri ebi (ma ị chọọ) Mkpụrụ ehu akwọrọ akwọ Ogiri (ma ị chọọ) Akanwụ Abacha kpọrọ nkụ/ maọbụ nke mmiri Azụ (nke ọbụla ị chọrọ) Ngwa nrị ndị ọzọ. E si n'akpụ enweta abacha Etu esi agwọ ya Abacha n'atọ ụtọ sitere n'ihe dị icheiche etinyere na ya. Ị ga-eso usoro obere obere ka ị nweta ihe ị chọrọ. Ka anyị bido. Tinye abacha gị na mmịrị dịtụ ọkụ, chere ka nkejị atọ gaa, wụnye ya na myọ, dosaa ya n'efere Wunye mmanụ nri n'ite. Tinye akanwu. Kpaghaa ya nke ọma ka ọ ghọrọ ncha. Tinye ehu ma ị chọọ Tinye oporo, ose, ngwa nrị na yabasị (tinye ụgba na ogiri ma ị chọọ). Kpagharịa ha niile ọnụ Tinye abacha n'ite gwakọrita ha niile ọnụ Tinye nnu maọbụ na ngwa nri ga ezu ya Sie ya nwobere oge (ntabi anya ise/iri) n'ọkụ ma ị chọọ ka ọ dị ọkụ Nrị eghego! Kunye nrị a n'efere, tinye ụtazị, aṅara/akwụkwọ aṅara, azụ, anụ na ihe ndị ọzọ ka i siri chọọ. Onwekwara etu ozọ esi esi ya bu nrị Weta akanwu. Tinye ya n'efere, tinye otu iko mmịrị jụrụ oyi. Kpagha ya ọfụma Tinye manụ, kpagha ya rue mgbe ọgbara ụfụfụ Tinye abacha n'ime ya, bido ịgwọ ya Na entiye mmiri etu ị si chọ Kunye ya n'efere wee kwanye ya azụ, anụ ewu/ehi, kanda maọbụ okporoko na ihe ndị ọzọ chọọ ya mma Ọ bụrụ azụ ndụ, ghee ya eghee maọbụ mịa ya n'ọkụ Ọ bụrụ okporoko maọbụ azụ kpọrọ nkụ, tinye ya na mmịrị ọkụ, wepukwa ọkpụkpụ dị na azụ ahu. Jiri ihe ọbụla ị chọrọ rie ya Rie nrị gị, hichaa ọnụ. Ṅụọ nkwọ ọcha. Ị ga-ekwe n'ịsị maka ọ ga-adị ụtọ! Akụkọ ga-amasị gị Ihe ị na-amaghị maka ụkwa ị na-eri Ịma esi ofe egwusi? Mụta ya ebe a
[ "Nri", "Nchekwa nrị", "Nrị na-edozi ahụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43638054
Mmadu atọ emerụọla ahụ n'isiụlọọrụ YouTube
Mmadụ abụọ emerụọla ahụ site na mgbo ebe otu onye ọzọ lojiri ọkpa ebe ọ na-agba ọsọ na mwakpo Youtube.
2018-04-04T06:24:57Z
Nwanyị bu egbe emerụọla mmadụ ato ahụ n'isiụlọọrụ YouTube
Ndị uweoji n'ihu ụlọọrụ Youtube Youtube bụ ụlọọrụ nọ n'ọkpuru Google Ndị uweoji na mpaghara ugwu California ekwuola n'otu nwaanyị bu egbe emerụọla mmadụ atọ ahụ n'isiụlọọrụ na-emepụta ihe onoyonyo a kpọrọ Youtube tupu o gbuo onwe ya. Ndị ntaakụkọ na mba Amerika enye la aha nwanyị a ka Nasim Aghadam ma kwukwa na ọ bụ esemoku ezịnaụlọ kpatara mwakpo a E chere na otu nwoke so na ndị merụrụ ahụ ụnyahụ bụ enyi ya nwoke ụlọọrụ, CBS na-ekwu. Umu nwaanyị abụọ dị afọ 32 na ọzọ dị 27 merụrụ ahụ na mwakpo a. N'agbanyehi nke a ndị ntaakụko na-ekwu, ndị uweoji ekwụpụtabeghị ihe nwaanyị ji buru egbe wakpo ndị mmadụ na Youtube. Ndị ọrụ na Youtube kọwara ihe na-eme n'elu igwe okwu: Aghadam bụbu onye na-emepụta ihe onyonyo na Youtube katọrọ Youtube n'oge gara aga maka ọ sị na ha na-akpachị ihe onyonyo ya. Akụkọ ga-amasị gị Ndị nchịkọta ise nwere ike ịnọchi Conte Ibrahimovic ejirela goolu abụo bata LA Galaxy Nwanne egbuola nwanne ya na Sango Ota
[ "Amerika", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "National security" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43190129
Ị ma uru ọjị bara n'ala Igbo?
Igbo na-asị n'onye wetara ọjị wetara ndụ, ya mere ọjị ji bụrụ ihe dị oke mkpa n'omenala Igbo.
2018-04-04T11:50:40Z
Ị ma na ọjị anaghị anụ bekee n'ala Igbo?
Oji Igbo 'Onye wetara ọjị wetara ndụ' Ọjị bụ otu ihe ị ga-ahụrịrị n'emume ọbụla gbasara ala Igbo. Ọjị na ịwa ọjị dị oke mkpa n'omenala ndị Igbo, maka na Igbo na-ekwu na "onye wetara ọjị wetara ndụ". Ụfọdụ ndị Igbo kwenyere na ỌJỊ pụtara "Omenala Jikọtara Igbo". Etu esi enweta ọjị Ọjị bụ mkpụrụ osisi a na-akụ akụ ma na ọ na-epukwara onwe ya. Ọjị nwere ike ịmị n'ụlọ ma mịkwaa n'ọhịa. Ụdịrị ọjị dị Enwere ụdịrị ọjị dị iche iche, ụfọdụ na-aza aha site n'etu o si mịpụta. Abịa na Naịjirịa, enwere ọjị Igbo ma nwee ọjị ugwu Awụsa ma nwekwaa nke ndị ọdịda anyanwụ bụ ndị Yoroba. Ọjị Igbo na-agbakarị n'ibe sitere n'atọ ruo ibe asaa. Igbo na-akwanyere ọjị gbara ibe asaa ugwu, ụfọdụ na-egbukwa ọkụkọ ma ha hụ ya bụ ọjị. Ọjị Awụsa Aha ọjị dị iche iche Ọjị ugo bụ nke na-acha ọcha, a na-akpọ ya ugo maka na ọ na-ama mma n'anya Ọjị ikenga na-enwe ibe atọ, na-achakarị uhie uhie Ọjị ndị awụsa bụ nke a na-akpọ 'gworo', ọ na-enwe ibe abụọ na-achakarị ọcha Uru ọjị bara Ndị Igbo kwenyere na ọjị anaghị anụ bekee n'ụzọ ọbụla, ya mere eji eji ya eme omenala ndị Igbo dị iche iche dịka: Eji ọjị alụ nwaanyị n'ala Igbo Eji ọjị anabata ọbịa Eji ọjị edozi esemokwu n'etiti ndị mmadụ Eji agba agọ ọfọ/ekpe ekpere Eji ọjị achụ aja Eji ọjị agba ndụ Eji ọjị akwa ozu N'ala Igbo, inye onye ọbịa ọjị gosiri na ị nabatara ya, o na-egosikwa na ị hụrụ ya n'anya nke ukwuu ma nwekwaa ntụkwasị obi n'ebe ọ nọ. Ihe a na-eji ata ọjị N'omenala Igbo, enwere ihe ndị ọzọ a na-eji ata ọjị Ose ọjị nke bekee kpọrọ alligator pepper Akị ilu nke bekee kpọrọ bitter kola Mmịmị Ụfọdụ na-eji nzu ata ọjị Ose ọjị akwọrọ akwọ Ịwa ọjị Tupu awaa ọjị n'ala Igbo, a na-ebu ụzọ gọọ ọjị (kpeere ya ekpere). Ọ bụ iwu na onye kachasị bụrụ okenye ga-agọ ọjị, ebe ụfọdụ na-enye onye kacha bụrụ nwata ka ọ waa ya ma kesaa ya. Nwoke anaghị awa ọjị na be ndị ọgọ ya, ọ gaghị awakwa ọjị ebe ndị tọrọ ya nọ na-abụghị ma ha nyere ya ikike ịwa ya. Ọ bụkwa iwu na nwaanyị anaghị awa ọjị n'ala Igbo. Ọjị na ụmụnwaanyị N'ala Igbo, nwaanyị anaghị arị elu ọjị, ọ naghị aghọtu ọjị n'osisi ya. Nwaanyị anaghị agọ ọjị. Nwaanyi anaghị arị oji elu mana nwaanyị na-ere oji Anaghị ekwe ka nwaanyị tinye aka n'ime efere were ọjị ma ọ bụrụ na ụmụnwoke nọ ebe ahụ ewerechabeghị. Ụfọdụ na-aga n'ihu were aka ha nye nwaanyị ọjị ka ọ ghara inwe ohere tinye aka n'efere e jiri kee ọjị. Lee ihe nkiri a ịhụ ka Pete Edochie si gọọrọ BBC Igbo ọjị: Na ụka bịara egbochighị ndị mmadụ iji ọjị ekpe ekpere dịka esi eme ya mgbe gboo.
[ "Naijiria", "Omenala", "West Africa", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43484402
Lee nri ogbenye 10 ọgaranya na-erizi
Ụfọdụ nri a ma na mbụ dịka nke ndị ogbenye bụzi ihe ndị ọgaranya wakporo n'ihi okwu gbasara ahụike.
2018-04-05T14:24:09Z
Lee nri ogbenye 10 ọgaranya na-erizi
N'ala Naijiria, ihe dịka afọ iri atọ maọbụ iri anọ gara aga, a na-ahụ ụfọdụ nri dịka nri ndị ihe na-esiri ike. Ọtụtụ nri ndị a bụ nri ndị mmadụ na-enwetara onwe ha n'ugbo ha maọbụ zụta ọnụ ala n'ime ahịa n'ihi na ndị na-achọ ha adịghị ọtụtụ. Mana ugbua, nri ndị a bụzị ihe na-amasị ndị ọgaraanya n'ihi mbawanye ọrịa tara nchara dịka ọbara mgbalielụ, ọrịa shuga, ọrịa obi, ọtụrụọkara (stroke), kansa na oke ibu bụ ọrịa ndị a na-ewe dịka 'ọrịa ndị ọgaranya'. Na nchọpụta ngalaba na-ahụ maka ahụike na mba ụwa bụ WHO n'aha ịchafụ mere n'afọ 2008, ndị Naijiria pasenti 11.2 n'ime nde 169 bụ ndị nwere ọbara mgbalielụ ebe pasenti 2.7 nwere ọrịa shuga. Egwu ọrịa ndị a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji alaghachị na nri a na-eleda anya na mbụ nke mere na ugbua nrị ndịa a na-ada oke ọnụahịa nke bụ na aka ụmụogbenye anaghị eruzị ha. Lee 10 n'ime nri ndị ahụ: 1. Azụ friji A na-ahụbu azụ friji dịka nri ndị ogbenye Ihe karịrị afọ iri atọ gara aga, a na-ahụ iji azụ 'friji' sie nri n'ụlọ ndị ogbenye, ụmụakwụkwọ maọbụ mgbe ego adịghị mmadụ n'akpa, ebe anụ ehi maọbụ anụ ọkụkọ bụ maka ndị rijuru afọ. Otu onye bi na Lagos bụ Kingsley Udofa kọwara anya a na-eleda azụ mbụ n'okwu ya sị: "O nwere oge n'ala anyị bụ Naijiria mgbe azụ friji bụ maka ndị ogbenye. "Oge ahụ, a na-akpọ azụ friji aha ọjọọ dị icheiche iji kwaa ya emo dịka, 'Ozu azụ' n'asụsụ Igbo; 'Ókù Ékò' n'asụsụ Yoruba nke pụtara, 'Ozu Lagos' ; 'Àkpa asuko nse' n'asụsụ Ibibio nke pụtara, 'ọ nwụrụ anwụ ma mụrụ anya.' Ndị mmadụ na-ahara ịzụ ma rie azụ ndụ." Ugbua, egwu adagharịala. Azụ friji bụ ahụghị ma erighị nke ọtụtụ mmadụ gunyere ndị ọgaranya nke bụ na azụ na-adazị oke ọnụ n'ahịa. Ihe ị na-amaghị maka ụkwa ị na-eri Kedu ihe ofe Egusi gị na-enye ahụ gị? Ị ma etu esi agwọ abacha? Mụta ya ebe a Dịka Mịnịsta nta na-ahụ maka ọrụugbo bụ Sen Heineken Lokpobiri siri kwuo, ndị Naijiria na-eri azụ ruru nde 3.2 metrik tọn kwa afọ nke a na-atụbata ihe karịrị pasentị iri asatọ n'ime ya. Mata na metrik tọn puku iri pụtara kọntena puku nari atọ iri atọ na anọ. 2. Ede Ede na-agalazị oke ọnụ Ọ bụ ede ụrị ka ọ bụ ede koko ma ọ bụ achịcha, ede bụ nri ụganị, nrị ndị onweghị ka ọra ha ji agbado ume n'ihi na ha enweghị ego zụrụ ji. Mana ugbua, nri ede bụzị ụkwa achị n'aka ya a na-agba n'ihi na oke na ngwere na-erizi ya. Ewepụ obodo jiri ụtaraede mere nnukwu nri, ndị na-asọ nsọ nrị n'ihi ọrịa dịka ọrịa shuga, ọbara mgbalielu na ndị chọrọ ịta ahụ ekweghịzị ka aka ogbenye rute ede, nke na i go ede e ji esi ofe dịzị ka igo ahịa iwu. 3.Kanda Akpụkpọanụ ehi nke ndị Yoruba na-akpọ, 'kpọmọ', bụbu ihe ndị ogbenye ji emegharị ọnụ oge ha ahụghị ego zụrụ anụ ehi ma maọbụ anụ ọkụkọ. Dịka ihe si aga ụgbụa, ndị ọgaranya ewerela ya mee ezi nri, ebe e ji ya esi nri ọpụrụiche dịka edikakong maọbụ gwọ ya na ose ma were ya anụ mmanya. N'afọ 2014 mgbe gọọmenti si n'ọnụ onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ọrụugbo bụ Akinwumi Adesina kwuo na ha chọrọ ịmachi ndị mmadụ iri kanda nke butere oke iwe ndị mmadụ ma mekwa ka gọọmenti kpofuo atụmatụ ahụ n'ọhịa. Dịka ndị ọkachamara sị kọwa, kanda enweghị abụba maọbụ mmanụ ọjọọ a kpọrọ kọlesịtọrọl na bekee dịka anụ ehi nke ha kwuru na oke iri ya na-ebute ajọ ọrịa tara nchara dịka ọrịa obi na ọbara mgbalienu. 4. Ojoko Ụfọdụ na-akpọ ya ogede, ụfọdụ abịrịka, ndị ọzọ ojoko, ebe ọtụtụ na-akpọ ya une maọbụ unere. Ụmụ ogbenye na-eji mmanụ eri nke ahụrụ n'ọkụ, ma jiri ya sie agwa mana ugbua, ọgaranya emeela ojoko nnukwu nri. Ojoko bụ ezi nri na-edochi ahụ nihi na o nwere faiba, na mineral ndị ọzọ na-enyere ndụ aka dịka magnesium, phosphorous na potassium. Dịka ndị ọkachamara ahụike siri kọwa, ojoko na-enye ọbara mgbe e siri ya na-achaghị acha. 5. Ejula Ejula bụ ezi nri na-enye ihe n'ahụ ma ọ na-adazi oke ọnụ ugbua Ma anụ adighị, azụ adịghị, ogbenye na-aba n'ọhia kpara ejula, were sie nri. Ogaranya, enwebughị efe ejula mgbe mbụ n'ihi na, dịka ndị Igbo ji ya ekwu okwu, ahụhụ dị na imecha ejula. Ma ugbua, iji ejula isi nri bụzị akara ejiri mara ọgaranya n'ihi oke ọnụ ahịa ya. Ejula bụ ezi nri nwere proten, calcium, selenium, magnesium ma na-enye ọbara. 6. Garị Garị bụ nri ma ogbenye ma ọgaranya na-erizi Iri garị, ọ kachasị mgbe aṅụrụ ya aṅụ, bụ ihe a na-ewe dịka nri ndị ụwa na-atụ n'ọnụ maọbụ mgbe ego kọrọ gị n'akpa na mbụ. Ị jụọ ụmụakwụkwọ bi n'ụlọakwụkwọ ha ga-akọwara gị etu ịji ọpapa, azụ e ghere eghe maọbụ anụ mkpọ aṅụ gari si zọọ ha ndụ. Ugbua garị bụzị ahịa iwu. Ọgaranya na ogbenye na-azọzị garị nke otu ọba a na-akpọ 'painter' na-ada ihe karịrị nari naira ise (N500). Onye ọkammụta ọrịa kansa n'ụlọọgwụ Lagos University Teaching Hospital, bụ Dr Remi Ajekigbe kwuru na ihe mere ọtụtụ ndị Naijiria ji arịa ọrịa kansa ugbua bụ na ha anaghị erizi nrị ala anyị dịka garị, ji nke nwere faiba ka ma ha na-eri nri ndị bekee. 7. Agwa Agwa bụ ezi nri na-edozi ahụ Agwa bụ nri ọzọ e jiri mara ndị ogbenye mana ọtụtụ ọgaranya na-erizi ya. Agwa na-enye proten ma na-enyekwa ọbara. Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na ihe ha na-enye na-ekwu na agwa kacha mma maka nweta protein karịa anụ ehị n'ihi na onweghị abụba ọjọọ nke a kpọrọ Kọlesịterọl. 8. Ukwa Ụkwa bụ oke oriri pụrụ iche onye ike dị na-akwado Ụkwa bụ nrị ndị ọgrlanya na-eleghara anya na mbụ, ikekwa n'ihi ahụhụ dị na-ikwado ya, mana ugbua, ọ bụzị onye ji ego na-eri ụkwa. Ụkwa na-enye proten, ọbara, potassium nakwa ngwa ndị ọzọ na-edozi ahụ. 9. Ji mmiri Ji mmiri nwere fibre Ji mmiri bụ nri ndị mmadụ anaghị erikarị na mbụ n'ihi na ọ naghị atọ ka ji. Sọọsọ ndị ogbenye jibu ya achụ agụụ. Mana ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ gunyere ndị ọgaranya na-eri ya. Ndị na arịa ọrịa shuga na-erikwa ya. Ndị nchọpụta na-akọwa na ji mmiri nwere fibre rie nne, obere "sodium" na nnukwu "potassium" nke mere e ji kwuo na ọ na-adị ndị na-arịa ọrịa shuga mma n'ahụ. Cheta na "fibre" na-enyere nrị aka igwepịa n'afọ (digestion), oke "sodium" so ebute ọbara mgbalienu, ebe "potassium" na-akụjulata ọbara, chụmie mmadụ inwe ọrịa okwute akụrụ (kidney stone). 10. Isha Isha na-adazị oke ọnụ nke na aka ụfọdụ ogbenye eruzi ya Ndị enweghi ego na-ejibu isha esi nri oge ha e nweghị ego anụ maọbụ azụ, ma ugbua, isha bụzikwa maka ndị nwere ego n'ihi oke ida ọnụ ahịa. Ihe mere ndị mmadụ ji achụzị nrị ndị ogbenye Dika ọkammụta na ihe gbasara nri na ihe ọ na-arụ n'ahụ bụ Dr Florence Uchendu si kọwa ihe mere na ọtụtụ ndị mmadụ na-eri nri a na-agbara ọsọ ugbua karia bụ maka na ọrịa dị na Naijiria ugbua dịka ọrịa shuga, ọbara mgbalienu, ọtụrụọkara(stroke), kansa. "Ọrịa dịzị na Najiria bụ ọrịa dị n'obodo oyibo anyị anaghị arịabu mbụ. Ihe dika ọbara mgbalienu, ọrịa shuga juziri kịta." " Ndị mmadụ amatago ihe ị ga-eri onyewe gị nsogbu n'ahụ ma nwekwa ike nyewe gị nsogbu n'ahụ." Akụkọ ga-amasị gị: Ụgbọ agha Saụt Korịa agala Ghana Anthony Joshua Vs Joseph Parker: Onye bụ dike?
[ "Naijiria", "Nri", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/43651610
Mahadum Covenant dara iwu - ọkaiwu
Ndị mmadụ egosiela iwe ha n'elu atụmatụ mgbasa ozi bu sochal midia maka ihe mahadum Covenant mere.
2018-04-05T15:26:46Z
'Mahadum Covenant kpụrụ ụmụakwụkwọ isi dara iwu'
Ụmụagbọchọ na-ese foto Ụmụakwụkwọ mahadum ahụ enweghị ikike iji ekwenti ga ebe ahụ Ndị mmadụ jisike na-egosi iwe ha n'elu atụmatụ mgbasa ozi nke a kpọrọ Twitter maka akụkọ pụtara ebe otu mahadum bu Covenant kpụrụ ụmụakwụkọ ha isi. Ụmụakwụkwọ a na-ekwu na ihe kpatara eji kpụ ha isi bụ maka na ha ejighi akwụkwọ nsọ ga na chapụl ha n'ime ụlọakwụkwọ ahụ. Otu onye ọkaikpe bụ Precious Nwankwo gwara BBC Igbo na ndị isi n'ụlọakwụkwọ ahụ dara iwu na-ahụ maka nchekwa oke ruru mmadụ. Gee ntị ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju: Otu onye si na mahadum ahụ pụta achọghị ka-enye aha ya sị na nke a bụ obere ihe n'ihe ndị ọzọ mahadum ahụ na-eme ụmụakwụkwọ ha. Ọ sị: "mahadum ọ bụla nwere ihe dị njọ na ihe dị mma maka ya, nke a a gaghị a pụ iche". Mbọ BBC gbara inweta Mahadum Covenant ka ha sa ebubo amịtaghị mkpụrụ. Mgbe onye ntaakụkọ BBC kpọrọ onye registra madadum n'ekwenti, o kwuru na ya enweghị ọsisa ọbụla. Nwata akwụkwọ ochie ahụ kwukwara na ụmụakwụkwọ ahụ kwesiri ị wetu obi gụọ akwụkwọ si ebe ahụ pụọ. Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu social media gbasara akụkọ a: Akụkọ ga-amasị gị Iba Lasa ekesala rue steeti 20 Nwoke akụgbuola nwa ya n'Enugwu Maaida Bio abụrụla onyeisiala Sierra Leone
[ "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/43665477
'Aguleri na Igboukwu abụghị mbido Ndigbo'
Eze na-achị Nri bụ Emelie Okika kwụdosiri ike na-ekwu na Nri bụ isi mmiri Ndigbo.
2018-04-06T06:32:20Z
Ebee ka Igbo malitere?
Mmanwụ n'ọgbọ mmemme Mmanwụ bụ otu njirimara Ndigbo Eze na-achị Nri bụ Ichie Emelie Okika adọọla obodo Aguleri na Igboukwu aka na ntị ka ha kwụsị ịzọ onye bụ isi mbido Ndigbo niile. Okika kwuru kusie ike na ọ bụ Nri bụ ebe Ndigbo siri pụta, ma kwukwa n'ihe gbasara isi mmiri Ndigbo bụ okwu mmuọ na e kwesịghị iji mee ihe ndọrọndọro ọchịchị. Ọ bara obodo Aguleri n'Igboukwu mba maka mbọ ha na-agba idegharị akụkọ mbido ala Igbo, ma gwa ha ka ha wepụ aka enwe n'ofe ka iwe ghara iwe ndị chi e nwere. Uru ọmụgwọ bara n'omenala Igbo Ị ma etu esi agwọ abacha? Mụta ya ebe a Kedụ ihe bụ ebumnuche gị maka ịgba mkpe? O kwuru sị "Ọ bụ eziokwu na anyị na ndị Aguleri bụ otu mana ihe dị iche bụ na agụ ndọrọndọrọ ọchịchị dị be ha. Igboukwu abịadịghị nso n'ihe gbasara akụkọ a". Okika sị na Eri bụ nna ala Igbo niile si ala Israel mapụta bụ ọkpara nke ise Gad bụ nwa asaa nke Jacob. Nakwa Eri na ndịotu ndịọzọ sị ala Egypt pụta njem tupu ọpụpụ ndị ala Israel n'Egypt. O sị "Ha mere njem n'elu mmiri ma rue ebe mmiri Omambala na Ezu zuru onwe ha a na-akpọ 'Agbanabo' dị n'obodo Aguleri ebe mmụọ na-edu ha sị ha kwụsị rụọ obodo'. Akụkọ ga-amasị gị: Maaida Bio abụrụla onyeisiala Sierra Leone Iba Lasa ekesala rue steeti 20 Mahadum Covenant dara iwu - ọkaiwu
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Naijiria", "Omenala", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43665487
Gụọnụ ndị ọchịehi ndị oyiegwu -Ụlọomeiwu
Ndị ụlọomeiwu nta si Benue steeti akpọọla oku ka gọọmenti etiti gụọ ndị Fulani na-achị ehi "ndị oyiegwu".
2018-04-06T06:41:50Z
Ụlọomeiwu: Gụọnụ ndị ọchịehi ndị oyiegwu
Ndị nche obodo bu egbe Ndị obodo dị na mpaghara ebe ndị ọchịehị nọ ebidola ị chekwa onwe ha Ndị omeiwu ndị a ndị kpọrọ oku a ụnyaaahụ bụ Tọsday n'Abụja si ka gọọmenti kwụwa ndị agha na obodo niile dị na Benue steeti ebe ndị Fụlanị na-achị ehị na-awakpo, kama Ọsọ Nwamba nke bụ egwu onye gbacha ọ la. Ndị omeiwu mmadụ anọ; John Dyeghndị, Dickson Takighir, Mr. Samuel Udende, Mark Terseer-Gbillah, ndị kwuchitere ndị ọzọ mara atụ na bido n'ụbọchị abụọ rue nke anọ ọnwa Eprel, na e gburu mmadụ iri abụọ ọhụrụ n'ebe ahụ, ebe ọtụtụ ka na-efu efu. Ha boro ebubo na onweghị enyemaka ọ bụla si na aka ndị ọrụ nchekwa n'ebe ụfọdụ ọdachịi ndị a mere. Ha were kpokuo gọọmenti etiti ka ọ gụọ ndị ọchịehi, "ndị oyiegwu". Mmadụ 27 anwụọla na Kogi Ndị Benue apụtaghị nabata Buhari E gbuola mmadụ 11 na Plateau steeti Ndị omeiwu a gosiri mgbakwojuanya na a kwụsịrị Ọsọ Nwamba nke ndị agha na steeti ahụ ebe ọ na-aga n'ihu na agbataobi ha dịka na Taraba. Na nkọwa otu n'ime ha bụ Takighir, nkwafu ọbara nke mere nsonso a mere na Ikyon na Agasha na abala atọ na abali anọ nke ọnwa Eprel; ndị ọchịehi kpara mkpamkpa na Semaka, Asom na Babanruwa na abali atọ nke ọnwa Eprel ebe ha chetara ndị obodo Udei na Umenger n'a abalị abụọ nke abụọ Eprel. "Otu a ka o siri mee na mpaghara Sengev, Mbakyondo na Mbapa dị n'okpuru ọchịchị Gwer-West dịka ndị ọchịehi ji ngwa agha na akpa ike ebe ahụ. "Na Tsegaase,ha gburu mmadụ abụọ, ebe otu onye na-efu na Zwatema, e gburu mmadụ abụọ na Tse Adeke, otu onye na Tse Adudu, ebe otu onye na-efu na Tsekelefu. Ka ọ dị ugbua anyị amatabeghị mmadụ ole ihe metụtara n'Enger. N'abali atọ nke ọnwa Eprel, e gburu mmadụ anọ n'Anyebe, otu onye na Mbavihi nke wardụ Tonbo dị n'okpuru ọchịchị Logo local government." Akụkọ ndị ga-amasị gị: Lee nri 10 ndị ogbenye ọgaranya na-erizi Mahadum Covenant dara iwu - ọkaiwu Gịnị butere mkpamkpa n'eme na Kogi? Ndị omeimu ndị a kwuru na ọdachị ndịa niile mere na agbanyeghị na ndị agha na eme ọsọ Nwamba na steeti ahụ, ma ga n'ihu kwuo na ọ gbara ha gharịị na ndị agha kwụsịrị 'Ọsọ Nwamba' na-agbanyeghị gbuogbuogbuo nka na-eme ebe ahụ. Ha kporo oku na gọọmenti ziga ndị agha na obodo ndị nsogbu a na-emetụta. "Anyi na-akpọ gọọmenti etiti oku ka ha kọwara ndị Benue na ndịị alal Naijiria ihe mere na a kwụsịrị 'Ọsọ Nwamba' naa Benue ebe ihe na-ebe ka na-ebe. "Anyị chọrọ ka gọọmenti ziga ndị agha na Benue dịka o kwesịrị ma nwe ebe ndị agha na-anọ na mpaghara ebe ihe ndị a na-eme were rue mgbe nsogbu ga-abịa na njedebe. "Anyị na-akpọ gọọmenti etiti oku ka o mee ọ gụọ ndị ọchịehị 'ndị oyiegwu ozigbo n'ihi mpụ na imebi ihe ha na-eme. Ndị mba ụwa lee anya ma hụ ka ndị a si acho ikpochapụ ndị Benue."
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Benue steeti", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/43636118
Ọgbaghara ga-ada na 2019 - Kukah
Bishop Matthew Kukah ekwuola na ọgbaghara nwere ike ịda na ntuliaka 2019 ma ihe dịrị otu a gawa n'ihu.
2018-04-06T10:36:25Z
Kukah: Ọgbaghara ga-ada na 2019
Matthew Kukah na Naịjirịa Bishọp Kukah sị na mwufu obara na mmebi akụnaụba obodo Naịjiria karịrị akarị. Bishọp nke Sokoto Katọlik Dayọsis bụ Bishọp Mathew Kukah ekwuola na ọgbaaghara nwere ike ịda na Naịjiria dịka ime ntụlịaka ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 nna-abịa nso. Ọ sị na onweghị ịhe ga eme ka ọgbaaghara aghara ịda na Naịjirịa ma ọbụrụ na akwụsịghị ọgụ na mgba a n'ada ebe niile na Naịjirịa. Kụkah kwuru nke a na-ozi ya na Africa Report Magazine nke Eprelu. Bishọp Kukah kwuru na ọ ga ata akpụ ị gbanahụ ọgbaaghara na ntụliaka nke 2019. N'ọnụ okwu ya, "ọ ga abụ ezigbo ọlụ ebube ma ọbụrụ na ọgbaaghara adaghị na ntụliaka 2019". Akụkọ ga-amasị gị Ndịagha asaala TY Danjuma Ụmụaka Dapchi ezutela Buhari 'Anyị enweghị okwu ịsa ihe Mama Boko Haram kwuru' Ọ sịrị na ihe ojiri kwuo nke a bụ maka ọgụ na mgba juru ebe niile na Naịjiria ugbua. "O metubeghị m n'obi otu a mbụ. Ekpere mụ bụ ka o metu gọọmenti n'obi ịmata ụdị iwe dị ndị mmadụ n'obi". O kwuru na ọnọdụ Naịjirịa ugbua kwesiri ịna-emetu nwafọ obodo a ọbụla n'obi. Kedụ maka ijeri dọla gọọmenti weputere maka nchekwa obodo? Mgbe Bishọp Kukah na BBC gbaritara ụka anyị jụrụ ya maka nde naịra gọọmenti tinyere na-chekwa obodo. Bishọp Kukah zara na ihe kacha mkpa abụghị ị me gbanụgbanụ me ihe ga enye aka ị me ntụliaka ọchịchị nke ga eme ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị biwakwa ndụ okeọzụ ka ha si ebe, nke a gaghị abara ndị ha n'achị ụrụ. Ọ sị na tupu udo abata na Naịjirịa na nkwafu obara ga akwusị kpamkpam. Bishop Kukah zara na ajụjụ a sị: "Ejighị ego egote udo. Nụrụ ihe okwuru na ụjụ na asụsụ bekee. "Ọbụghị ụkọ ego mere na udo adịghị na Naịjirịa, ka ma ọ bụ oke ego dị na obodo a kpatara ya. "Etinyela otụtụ ego na ndọrọndọro ọchịchị onweghị isi. "Ya bụ itinye ọtụtụ egọ abụghị nsogbụ, ọkachasị na obodo ihe niile bụ ego dịka Naịjirịa. "Gọọmenti etinyela ọtụtụ ego na mmiri, anyị enweghị mmiri. Ha etinyela ọtutụ ego na ọkụ, anyị enweghị ọkụ. Ihe ga enweta udo na Naịjịrịa abụghị egbe na mgbo." Ọ gara n'ihu kwuo na ihe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eme bụ ka enwe ike mee ntụliaka ọzọ ma ghara ime ihe ga-abara ndị mmadụ uru. Bishọp Kukah kwuru na ọrụ gọọmenti bụ ime ka ndị a na-achịachị nwee ntụkwasị obi na agbamume. Mana ọtụtụ ndị Naịjiria enweghị ya. Ọnọdụ dị otu a na-emebi ọchịchị onyekwụọụche ya anyị nọ n'ime ya. Kedụ ihe i chere maka ụmụaka Dapchị a tọhapụrụ? Ihe ahụ rụtụrụ aka ịgosị ka gọọmenti sị ahazị ozi a na ezigara ndị a na achị. Bishọp Kukah sị na ọbụ ihe mgbagwoju anya na ụdị ihe ahụ mere onweghị onye mara isi ya na ọdụ ya maọbụ ihe kpatara ya bụ ihe. "Ihe a na-anụ bụ sọsọ asịrị. Ọ naghị enye aka ma ọlị. "Nke ka njọ bụ na o nwere otu onye aka jị ejị maka okwukwe ya." Ụdị ihe a abụghị ihe e kwesiri ị na-anụ na Naịjịrịa ugbua.Ọ jọgbụrụ ụdele ma sịgbụọ nkakwụ."
[ "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/43665478
Offa: ndịohi ana-amara ndị uweojii aka?
Ụzụ na-akpọ n'obodo Offa dị na Kwara steeti maka ndị uweoji, mmadụ ndị ọzọ ndị ojiegbeezu gburu.
2018-04-06T12:04:07Z
Offa: Ndịohi egbuola mmadu 17
Ụlọakụ nke dị n'obodo ahụ Ihu otụ n'ime ụlọakụ ndị a wakporo Mmadụ karịrị mmadụ iri na ise anwụọla, n'ime ha ndị uweojii itoolu mgbe ndịohi bu egbe wakporo ụlọakụ ruru ise n'obodo Offa dị na Kwara steeti ụbọchị Tọọdse. Ndị nọ ebe ihe a mere sị na ndịohi ahụ ji ogbunigwe gbawa ebe ụlọakụ ahụ na-echekwa ego mmadu tupu ha-eburu ya pụọ. Ha kwukwara na ndị a bu ụzọ ga n'ụlọọrụ ndị uweoji gbagbuo ihe niile ha hụrụ ebe ahụ tupu ha gaa ebe ụlọakụ ndị ahụ dị. Ha gbakwara mbo gbochie ụzọ abụọ batara obodo ahụ si na Ilorin n'Osogbo, obodo ndị agbatobi dị nso n'Offa. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Ajayi Okasanmi (DSP) onye kwuru na nke a bụ ezie kwukwara na ndị omekome ahụ gburu ndị nkịtị asaa. Akụkọ ga-amasị gị Ọgbaghara ga-ada na 2019 - Kukah 'Aguleri na Igboukwu abụghị mbido Ndigbo' Nwoke agbagbuola nwunye na nwa ha Ihe a wutere ndị mmadụ nnukwu dịka ha gosiri n'elu atụmatụ mgbasa ozi:
[ "Naijiria", "Kwara steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43662223
Kedụ aha otutu ndị ị ma?
Ndị Igbo nwere aha otutu ha na-etu ndị masịrị ha nke ukwuu dịka ụmụnne, nne, nna, di, nwunye na ndị ọzọ.
2018-04-06T13:52:03Z
Kedụ aha otutu ị na-etu onye ị hụrụ n'anya?
BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụọnụ gbasara ụfọdụ aha ụtọ ha na-akpọ ndị dị ha n'obi. Ha kpọpụtakwara aha ụtọ dị icheiche. Gere ihe ndị a kwuru ebe a. Onye mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim
[ "Ezinụlọ", "Asụsụ", "Naijiria", "Omenala" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43673039
Ụmụnwaanyị dị ime emeela ngagharị iwe
Iwe ụmụnwaanyị a bụ mbuli ụgwọ ha na-akwụ maka nyocha ahụ na afọ ime ha.
2018-04-06T20:04:03Z
Ụmụnwaanyị dị ime emeela ngagharị iwe n'Ondo steeti
Ụmụnwaanyị dị ime Ụmụnwaanyị dị ime achọghị ịkwụ ọtụtụ ụgwọ ndị ụlọọgwụ na-ana ha Ihe ruru ụmụnwaanyị narị abụọ (200) dị ime mere ngagharị iwe n'isi obodo Akure dị n'Ondo steeti ụnyaahụ. Iji kwuputa etu o siri jide ha n'olu, ụmụnwaanyị ndị a gara n'Ondo State Specialist Hospital mere ka gọọmentị mata na ha achọghị ịkwụ ụgwọ ọhụrụ a na-asị ha kwụọ. Ha nọchiri ọnụụzọ ụlọọgwụ ahụ ma gbochikwa ndị bịara ịnata ọgwụgwọ ịbata n'ụlọọgwụ. Ụmụnwaanyị a kwuru na ego a na-ana ha pụtara N25,000 maka ịmụ nwa na nkịtị nakwa N50,000 nke ịmụ nwa site n'ịwa afọ, karịrị akarị. Akụkọ ga-amasị gị Offa: ndịohi a na-amara ndị uweojii aka? Ọgbaghara ga-ada na 2019 - Kukah Bọọlụ: Gịnị ga-eme na Premiership echị? Ụmụnwaanyị a kwuru na ha na-akwụbu N1,000 iji denye aha ha maka nyocha ahụ tupu a mụọ nwa nke bekee kpọrọ antenatal, mana ugbua ha na-akwụzị N4000. Ha kwukwara na ebidoro ịna ha N500 ọzọ maka oge ọbụla ị bịara nyocha antenatal. Iwe ha bụ na ha anaghị akwụbu ụgwọ iji mụọ nwa karịa N1,000 ahụ oge Olusegun Mimiko nọbu n'ọchịchị, mana ugbua o juru ha anya ụdịrị ego a na-ana ha. Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ya
[ "Naijiria", "Ondo steeti", "Ahụike", "Afịrịka", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43680589
Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Super Falcons ritere ọkpụ 8
Ndị France gbara ndị Super Falcons ọkpụ asatọ asataghị otu, mkpa ọdị ịkwado agaum akwụkwọ na EU ekwetala ịkwado agha a na ebuso mpụ ọzọ na Naịjirịa.
2018-04-07T09:34:14Z
Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Super Falcons kpọchuru ajọọ ihu ụnyahụ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa. 'Social media' nwuru ọkụ maka Aisha Wakil Aisha Wakil kwuru na Bokoharam ga-atọghapu nwa Dapchi akpọrọ Leah Sharibu Kamgbe Aisha Wakil kọwachara BBC Igbo n'asụsụ Igbo ka ya ndị oyi egwu a sị akpa,ọtụtụ ndị Igbo na-ekwu uche ha na igwe okwu 'social media'. pia ebe a kị ihụ ya. France 8 Super Falcons 0 Chikwelu Oparanozie bụ onye ndụ ndị Falcons na ya bụ egwụrụegwụ Ụmụnwaanyị egwu bọlụ nke Naịjirịa bụ Super Falcons na nke ndị France sọrọmpi enyi na enyi ụnyahụ bụ Fraide. Ya bụ mpi ha sọrọ kpọrọ ndị super Falcons ihụ ọjọọ site na ịgba ha ọkpụ asatọ chara acha na ọgbọ egwuruegwu MMArena na Le Mans, France. Gọvanọ Ọbialọ kwuputara mkpa ọdị ịkwado agaumakwụkwọ Willie Obialo bụ Gọvanọ Anambra Steeti Gọvanọ Willie Obialo nke Anambra Steeti ekwupụtala mkpa ọdị ịkwalite agụm akwụkwọ na steeti ahụ. Okwuru nke a ụnyahụ mgbe ọ gara emụme nkwado agụm akwụkwọ nke ndị Onyebuchi Chris Ifediora Foundation kpokobara na Aguleri. Onye nọchite anya ya na ya bụ emume bụ Joy Ulasi kwuru ọdịghị mma ị hapụrụ nanị gọọmenti ọrụ gbasara agụm akwụkwọ. Ndị uweojii London akasiela ndị mmadụ obi na London Agbagburu mmadu 6 na London n'izu gara aga Na mba ofesi, ozị sị London erụ anyị ntị sị na-ezipula ndị ụweojii narị atọ na ọgbe ndị omekaome kacha akpa ike. Egburu mmadụ 6 ma merukwa ụfọdụ ahụ na mpaghara London ụfọdụ n'izụụka gara aga. EU ekwetala ịkwado agha a na ebuso mpụ ọzọ Ndị a bụ agba nke abụọ ya EU na akwado agha a na-ebuso ndị omekome na Naịjirịa Ndị otu European union a ekwuputela mkpebi ha ịkwado agha a na-alụ megide ndị omekataraihepuujọ na Naịjirịa. Ọnụ na-ekwuru ndị ụlọọrụ United Nations na-ahu maka ọgwụ na mpụ bụ Sylvester Atere kwuru na nkwado nke a ga erụ afọ 3. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa Ụmụnwaanyị dị ime emeela ngagharị iwe Ọgbaghara ga-ada na 2019 - Kukah Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji Ihe nkiri taa
[]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43680596
France mere Super Falcon ịwa
Njọ ahịa mere ndị Super Falcons na mpi enyi na enyi ha na ndị France sọrọ ụnyahụ.
2018-04-07T11:42:23Z
France 8 Super Falcon 0
Iko mba Afrika nke ụmụnwaanyị Nke a bụ ugboro abụọ ndị France na-emeri ndị Falcons Ụmụnwaanyị egwu bọlụ nke Naịjirịa bụ Super Falcons na nke ndị France sọrọmpi enyi na enyi ụnyahụ bụ Fraide. Ya bụ mpi ha sọrọ kpọrọ ndị super Falcons ihụ ọjọọ site na ịgba ha ọkpụ asatọ chara acha na ọgbọ egwuruegwu MMArena na Le Mans, nke France. Mpi ha sọrọ bụ nke enyi na enyi maka nkwado egwuruegwu ụmụnwaanyị mba Afrika nke 2018. Ihe a bụ ụkwụ egwụ mbụ onye nkuzi ha bụ Thomas Dennerby nke Sweden tụrụ. Nke a bụ ugboro abụọ ndị France na-emeri ndị Falcons. Akukọ ndị ga-amasị gị: Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Super Falcons ritere ọkpụ 8 'Social media' nwuru ọkụ maka Aisha Wakil Ụmụnwaanyị dị ime emeela ngagharị iwe Nke mbụ bụ na iko mba ụwa nke ụmụnwaanyị nke agbara na Germany na 2011 bụ nke ha ji otu (1 - 0)ọkpụ were merie ha. France bidoro ozigbo amalitere ya bụ egwuruegwu chawa ọkụ nke bụ na ha chọrọ itiney otu golu na nkeji iri na anọ (nkeji 14) mana Chiamaka Nnadozie ekweghị ekwe. Okụ ndị France na-acha mịtara mkpụrụ na nkeji nke iri itoolu (nkeji 9) mgbe nwaada Eugenie Le Sommer tinyere ofu n'ọnụgolu. Mgbe ọ banyere nkeji iri abụọ na isii (nkeji 26) ritere akwụkwọ edo maka arụrụala ọrụsara onye France. Tupu ezụmike erụọ, France agbakanyela golụ atọ n'ọnụ gola ndị Super Falcons. Ka anatachara ezumike (nkeji 54 ), Desire Oparanozie yiri ha egwu site na pịawanyere bọlụ dị ọkụ na golu ndị France mana golii ha egweghị ekwe. Egwu Oparanozie menyere ha pụrụ ha n'anya mgbe onye otu ha bụ Aminata Dilalo tinyere golu ọzọ na ọnụgọlu ndị Super Falcon. Golu ọzọ nke Gauvin nyere sochiri azụ na nkeji 70 iji mezue ya ọkpụ ise ndị Falcon ji na-ụkwọ. Ha kabakwara ahụ imezụ ya ọkpụ asaa tinyere nke Faith Ikidi jị aka ya nye onwe ha bụ nke mezuru ya ọkpụ asaa. Tupu egwuruegwu ahụ abia n'isi njedebe, Marie-Charlotte Leger gbara mbọ tinye ofu golu ọzọ nke mezuru ya asatọ.
[ "Naijiria", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43690407
Ụka nne ndị Katọlik akpọtụrụ akpọtụ
Ndị nne ụka Katọlịk n'Naịjịrịa na-eme mmemme ụbọchị ha tata.
2018-04-08T12:47:13Z
Ndị Katọlik na-eme ụka nne taa
Ndị nne ụka Katọlik Ụka nne bụ emume ndị ụka Katọlik ji akwanyere ndị nne ugwu n'ụzọ pụrụ iche Ndị jịkọtara aka ọnụ chịkọba mmemme dị iche iche ịjị wee nwee aṅụrị na ụbọchị ndị nne abịakwala ọzọ. N'ụka a kara ndị nne na St Michaels Asata Enugwu, ụbọchị ụka, ndị ụkọchukwu;Fada Callistus Ani na Wilfred Agu kọwara na nne bụ ndị nwere obi umeala ma na ekpokọba ezinaụlọ ha ọnu. Na Holy Ghost Cathedral dịkwa n' Enugwu, Rev. Fr. Peter Acharakpọkuru ndị nna na ụmụaka ka ha gharakwa iji ndị nne gwuo egwu ma ncha. Achara toro ndị nne dịka ndị anaghị ekwe ka ọkụ ọbụla a gụnyere ha na-aka nyụọ. Hilda Dokubo nyere ndị nne ndụmọdụ ise dị mkpa Frank Edwards : Nne m rere ọgọdọ were kwadọ etimegwu m O nyere ọmụmatụ sị na ọ bụ ndị nne jị uka, ma na-ahụ na udo na mbawanye dị na ụwa. Ndị Katolik na Naijiria na-eme ụka nne na-apụta na oge Lent Ndị nne St. Micheals Asata guzobere mmemme dị iche iche dika, ịkwụ n'ahịrị zọ njem ka ndịagha, asọmpị onye nne ka mma nakwa ịwa achịcha bekee. Ndị otu ndị nne nke a kpọrọ CWO nke Holy Ghost Cathedral jị aka ha mee mmemme niile dị na ịka ụka tata ka e were mee ya bụ mmemme. Onyeisi ndị nne Holy Ghost bụ Patricia Achara n'onyeisi ndị nne St Michaels Asata dị n' Enugwu gwara ndị ha ka ha were ụbọchị tata malite ibi ezigbo ndụ nke na ndị agbataobi ha nile ga-ama na ha bụ ezigbo nne na-atụ egwu Chineke. E jiri ọtụtụ ụzọ sị ọṅụ na mmeme ndị nne Fada Achara jịkwa ohere ahụ kpere ndi nne na-achọ mkpụrụ nke afọ ekpere ka ha mụta nwa. Ụka nne bụ mmemme ndị ụka Katọlik na-eme kwa afọ ịjị kwanyere ndị nne ugwu dịka ide jị ụka. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ụmụnwaanyị dị ime emeela ngagharị iwe 'Mmegbu butere akwa nnwereonwe Ndigbo'
[ "Ikike ụmụnwanyị", "Ikike diri mmadụ", "Ụmụnyanyị", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/43691451
Ghana: Mmadụ isii anwụọla
Mmadụ isii anwụọla, ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ n'ogige ngwupụta ọlaedo dị na Ghana.
2018-04-08T15:28:44Z
Ghana: Ọdịda ogige nwupụta ọlaedo egbuola mmadụ isii
Enwela ọtụtụ ihe mberede n'ogige ngwupụta ọlaedo na Ghana. Enwela ọtụtụ ihe mberede n'ogige ngwupụta ọlaedo na Ghana. Ụlọọrụ ebe a na-egwupụta ọlaedọ dị na mpaghara ndịda nke mba Ghana adaala, gbuo mmadụ isii ma merụọ mmadụ abụọ ahụ. Ihe mberede a mere na Brong Ahafo nke dị kilomita narị anọ na iri atọ (430) site n'isi obodo bụ Accra mgbe a na-agbanwe elu ọwara ochie dị n'ụlọọrụ ahụ bụ nke daara ada. Ndị nwe ogige ngwupụta ọlaedo ahụ bụ otu ụlọọrụ dị na mba Amerịka akpọrọ Newmont bụ ndị kachasị na mmepụta ọlaedo n'ụwa. Ndị merụrụ ahụ bụ ndị ọrụ Consar Limited bụ ndị ji ọrụ ị gbanwe elu ọwara ahụ. Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ ahụ bụ Agbeko Azumah kwuru " A na-ekwupụta ọnwụ mmadụ isii, abụọ ndị ọzọ bụ ndị agwọrọla n'ụlọọgwụ ma sị ha lawa mgbe ihe a mechara na satọde." Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ghana na-eme mmemme nnwereonwe ha taa Onye nọ dịka onyeisiala mba Ghana ewerela oche Osote onyeisi ụlọọrụ ahụ n'Afrịka bụ Alwyn Pretorius kwuru " Ụlọọrụ Newmont niile nọ na mgbagwoju anya n'ihe mberede a. Ihe kachasị mkpa ugbu a bụ ikwado ezinaụlọ, ndị enyi n'akwa ndị ọrụ ndị a nwụrụ anwụ." Ụlọọrụ a akwụsịla ọrụ n'ebe ahụ ma chụpụ ndị ọrụ ya, dịka nyocha ka na-aga n'ihu. "Ndị uweojii na ndị nọ n'ebe ahụ, e meela ka ndị ọrụ gọọmentị gụnyere ndị na-ahụ maka akụnaụba dị n'ala mara maka nke a," Pretorius kwuru.
[ "Afịrịka", "Ghana" ]
https://www.bbc.com/igbo/43696629
Buhari: Aga m azọ ọchịchị 2019
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhhamadu Buhari ekwupụala na ọ ga-zọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'afọ 2019.
2018-04-09T11:15:33Z
Ntuliaka 2019: Buhari ekwuola na ọ ga-azọ ọzọ
Muhammadu Buhari Buhari bidoro chiwa Naijiria n'arọ 20155 Onye ndụmọdụ onyeisiala na ihe gbasara ụzọ mgbasaozi ọhụrụ bụ Bashir Ahmad deputara nke a na Twitter. Nke a ga-akwụsị arụmụka n'ebe dị icheiche ma Buhari ọ ga-azọ ọchịchị ọọ ka ọ bụ na ọ gaghị azọ. Aka na-achị Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai kwuru na Twitter ya na Buhari kwuru ebumnobi ya n'ọụ̀bakọ ndịisi otu pati APC na-eme ugbua. A na-etinye ihe ọhụrụ n'akụkọ a mere ugbua mana a ga-egosipụta ya n'uju n'oge nadighị anya. Biko mepegharịa ihuakụkọ a maka akụkọ zuruoke.
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43710696
Anambara esonyela na ndị emepụta mmanụ?
Gọọmenti etiti agụnyela Anambara steeti na steeti ndị ga na-eketa oke dịka steeti na-emepụta mmanụ agbịdị?
2018-04-10T08:58:58Z
Mitchell: Ọ bụrụ maka ntụlịaka, ọ gaghị enwe isi
Onyeisioche otu na-ahụ maka obodo ndị na-emepụta mmanụ na Naịjirịa nke a kpọrọ, 'Host Communities Producing Oil and Gas, HOSCON, bụ Prince Mike Emuh kwupụtara nke a n'ọgbakọ ndị eze nwere n'Awka, Anambra steeti unyaahụ. N'okwu ya, Emuh kwuru na gọọmenti etiti etinyela aka n'akwụkwọ banyere ịrụ ụlọọrụ na-esi mmanụ agbịdị iri na steeti iri na otu a na-egwupụta mmanụ. O gara n'ihu kwuo na a ga-arụ otu n'ime ụlọọrụ ahụ na-esi mmanụ agbịdị na Anambara steeti. O kwukwara na gọọmenti etiti ga-ewepụta ohere ọrụ 10,000, na steeti ndị na-egwupụta mmanụ nke ndị ntorobịa Anambara ga-enweta ọrụ dị 1,000 n'ime ha. Gọọmentị Anambara aghọpụtala ndị okpe udo Obiano achụọla kọmishọna ruru 18 Victor Umeh ebidola ọrụ dịka Sinatọ Anambara Sentralụ Obi Ọnịcha bụ Igwe Alfred Achebe kelere ya ma kwuo na ndị eze ọdịnaala ga-ewepụta kọmiti nke eze Aguleri, Igwe Christopher Idigo, nọ n'isi ya iji lebenye anya n'ebe a ga-amapụta maka iwu ụlọrụ ne-esi mmanụ agbidi ahụ yana etu a ga-esi họta ndị ntorobịa a ga-enye ọrụ. Na-agbanyeghị, ndị ọrụ anyị gakwara n'ihụ kpọtụrụ ndị Anambra Steeti ụfọdụ ọnụ n'erụ na-okwu uche ha maka akụkọ a. Onye mbụ anyị kpọtụrụ bụ ọdeakwụkwọ gọọmenti steeti ahụ bụ Solomon Chukwulobelu. Chukwulobelu sị na ka ọdị mgbe ahụ na ya agaghị asawu okwu obula maka ya bụ akụkọ maka na ya anọghị na ụlọọrụ mgbe ahụ. Okwere nkwa na ya ga gwa anyi nke bụ eziokwu n'izuuka ọzọ mgbe ya naruru. Gọvanọ Willie Obiano nọ n'agba nke abụọ ya dịka onye mbụ na'Anambra Steeti Asịsa Mitchell n'ihe Mike Emuh kwuru Onye ọzo anyị kpọtụrụ bụ Mitchelle Onugbolu nke bụ onye ndụmọdụ pụrụiche maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya na gọọmentị Willie Obianọ. Odoziakụ Onụgbolụ sị na ya bụ okwu ga abụ ihe magburu onwe ya ma ọbụrụ na ọ bịa na mmezụ. Okwuru na ọ teele aka atụwara anya ka gọọmenti etiti kpọ ya bụ okwụ aha. Mana ọ kara ị da ụda ma ọbụrụ na ya bụ okwụ sị n'ọnụ gọọmenti etiti dapụta. Mgbe ajụrụ ya ka ọchere na ọ bụghị maka ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 ka eji pụta kwụọ ọkwụ a. Akụkọ ga-amasị gị: Nkwa asaa Buhari kwere na ihe o mere Ịhe ndị Naijiria na-ekwu gbasara nkwupụta Buhari 'Wepụ aha IPOB dịka 'otu oyiegwu'
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43708730
Ejima atọ nna ha 'gbara ọsọ'
Kamgbe Ijeoma chọpụtara na ọ dị ime ejima atọ, ọ hụbeghi di ya rue ugbua. Ọ ndị mmadụ na enyere ya aka n'ụlọọgwụ.
2018-04-10T11:33:18Z
Amaghị m ebe nna ha nọ - Nwaanyị mụrụ ejima atọ
Ọ bụ ihe ịtụ n'anya na agabanyeghi na Ijeoma enweghi ejima na be ha, ọ mụrụ ejima atọ. Mana ihe bụ nsogbu bụ na kamgbe ọ chọpụtara na ime ya bụ ime ejima atọ, ọ hụbeghi di ya. N'okwu ya; "oge m hụrụ ya anya ikpeazụ bụ n'ọnwa Disemba.
[ "Ezinụlọ", "Naijiria", "Ụmụaka", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43710697
Ndị Fulani na-achi ehi egbuola mmadụ 2,000
Otu na-ahụ maka ikike dịrị onye ekwuola ọgbaghara dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo atala isi puku mmadụ abụọ n'ọnwa.
2018-04-10T14:10:41Z
Ndị Fulani na-achi ehi egbuola mmadụ 2,000 n'afọ a
Ehi Nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo na-emetụta ikọpụta ihe oriri Otu na-ahụ maka ikike ruru onye bụ nke akpọrọ "Coalition on Conflict Resolution and Human Rights in Nigeria" kwuru mmadụ ruru puku abụọ anwụọla ka puku na puku ọzọ agbala ọso ndụ maka nsogbu ndị n'etiti ndị na-achị ehi na ndị ọkọ ugbo. Ndị a kwuru ihe a n'akwụkwo nyocha ha depụtara ụbọchị Monde. Dịka onye ntaakụkọ BBC bụ Chris Ewokor sị kọwa, otu a kwuru na ha nwetara ọnụ ọgụgụ a site na ịgụkọ mmadụ egburu, ụlọ na ihe ndị ọzọ emebiri na ihe so ya ọgụ dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo banyere ala na mmiri. Otu ahụ kwuru na ọgbaghara ndị a metụtara steeti ndị dị na etiti ugwu Naijiria dịka Benue, Taraba, Plateau, Kogi na Nasarawa; nke mere ka ndị ọchịchị wezuga iwu Naijiria n'ụsọ iji gba mbọ nchekwa na mpaghara ndị ahụ. Okwu mwakpo ndị ọchị ehi a ga-ebi ebi? Ndi agha Naijirịa agọrọla isi ha Akwụkwọ nyocha ahụ gosikwara na e wezuga ọgbaghara dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo, ndị ohi kwanyere ahụ na nsogbu nchekwa e nwere were na-egbu mmadụ ma na-ezu ohi n'ọtụtụ ime obodo. Ka ọ dị ugbua, e zigala ndịagha na mpaghara ndị nwere nsogbu a metụtara, ebe ha nwụchigara ụfọdụ. Mana mwakpo ka na-aga n'ihu n'ọtụtụ ime obodo. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Anambara esonyela na steeti na-eme mmanu Nkwa asaa Buhari kwere na ihe o mere Ipob: Mpụtagharị Buhari ga-enye anyị Biafra
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/43715739
Ngwaagha ndị uweojii napụtara ndị mmadụ
Ndị uweojii egosila ngwaagha dị icheiche nke ha kpachiri site n'aka ọtụtụ ndị nchekwa ọdịnala dịka onyeisi ndị uweojii nyere n'iwu.
2018-04-10T15:28:04Z
Lee ngwaagha ndị uweojii Naịjirịa napụtara ndị mmadụ
Jimoh Moshood dịka ọ na-egosị ngwaagha ndị akpachiri Jimoh Moshood dịka ọ na-egosị ngwaagha ndị akpachiri N'ọnwa Febụwarị onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris nyere ndị kọmishịọna ndị uweojii Steeti niile iwu ka ha kpachie egbe, mgbọ nakwa ngwaagha nke dị n'aka ndị nchekwa ọdịnaala, ndị na-achị ehi, ndị ọrụ ubi na ndị nille na-eji ngwagha n'ụzọ na-ezighị ezi. N'ihi nke a, ndị ọrụ ọtawaike nke ndị uweojii hiwara malitere ọrụ n'ịchịkọta, ịkpachị nakwa nweghachị ngwaagha, egbe na mgbọ nke dị n'aka ndị na-ekwesighị ekwesi gụnyere ndị omeka ome. Ha mere nke a site na i nyocha, na nzaacha ebe nzuzo dị icheiche e zoro ngwaagha ndị ahụ site n'akụkọ kepukepu ha nụrụ. Ngwaagha ndị kpachiri: Egbe akpọrọ GPMG (General Purpose Machine Gun) dị abụọ Egbe akpọrọ AK47 dị otu narị na iri na anọ Egbe akpọrọ SMG dị asatọ Egbe ndị ọzọ dị icheiche dị narị atọ na otu. Ngwaagha niile a dị narị anọ na iri abụọ na ise, agbanyeghị na-agbatị kwuola ohere enyere ndị mmadụ ịwụsa ngwaagha ha n'aka ndị uweojii rue ụbọchị iri abụọ na otu. E hịwara mkpachị na mkpochapụ ngwaagha ndị a iji nyere ndị uweojii aka igbochi ọgụ dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ubi, ntọọrọ mmadụ, izu ohi, iyi ndụ egwu na ihe ndịọzọ. Mgbọ egbe dị icheiche so na ngwaagha ndị akpachiri Dịka ọ ka na-aga n'ihu, ndị uweojii agwala ndị mmadụ ka ha mee ka ndị uweojii mara maka onye ọ bụla ji ngwaagha n'ụzọ na-ezighiezi nke megidere iwu 'Firearms Act'. "Ndị uweojii a naghị ala azụ na nkwa ha ichekwa ndụ na akụnaụba ndị mmadụ na Naịjirịa" Jimoh Moshood bụ onye na-ahụ maka mmerikọta ndị uweojii na ndị ọdịnala kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndi uwe ojii anapụla ndị orụ nche ngwọ agha Kpọghachite ndị uweojii - Ibrahim Idris Ụmụ Igbo chị ọkụ n'asọmpị Commonwealth
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Ọgụ ndị na-achịehi", "National security" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43722285
Liverpool awụọla Man City n'ala
Mohammed Salah na Roberto Firmino ndị otu Liverpool bụ ndị gbara mbọ hụ na Man City dara n'ike n'ala.
2018-04-11T06:33:14Z
Champions League: Liverpool eruola agba nke anọ
Mohammed Salah Mohammed Salah nyere aka n'ime goolu iri ise Liverpool nyere n'afọ a N'asọmpị Champions League ụnyahụ Liverpool meriri Man City ọkpụ abụọ mana ha satara otu. Liverpool ji mmerị nke a ruo ọkara-ikpeazụ n'asọmpị iko Champions League nke mbụ n'ime afọ iri. Na mkpakọ akara ha niile, Liverpool meriri Man City ọkpụ ise mana ha satara otu. Etu Man Utd si napụ Man City ike Asọmpi Commonwealth: Naịjirịa agafeela na tenisi Ndị nyere goolu Afọ 2007-08 bụ ikpeazụ Liverpool ruru agba nke anọ n'asọmpị Chamions League Gabriel Jesus bụ onye nyere goolu nke mbu n'ime nkeji abụọ nke mbụ n'asọmpị a. Ọ bụ n'ọkara nke abụọ, na nkeji iri ise na isi n'egwuregwu ahụ ka Mohammed Salah bụbụ onye ha na-akpọ onye anwansị nyere goolu nke mbụ nke otu Liverpool. Roberto Firmino nyere Liverpool goolu nke abụọ na nkeji iri asa n'asatọ. Liverpool ha nwere ike iburu iko asọmpị Champions League? Ndị ogbubọọlụ chụrụ Pep Guardiola n'ọgbọ egwuregwu n'asọmpị a makana ọ na-abara ha mba Mmeri nke a enyeela Liverpool obiisiike na ha nwere ohere iburu iko a. Ndị ọkachamara n'ihe gbasara bọọlụ ekwuola na ndị na-agba n'ihu n'otu Liverpool nwere ike iyi ndị otu ndị ọzọ fọrụ na Champions league nnukwu egwu. Ugbua, ọ dịka na Real Madrid na Bayern Munich nwere ike iso Roma na Liverpool n'ime ndị otu ọkpụ abụọ. London: ụmụ ntorobia itoolu anwụọla Anambara esonyela na ndị emepụta mmanụ? Nkwa asaa Buhari kwere na ihe o mere
[ "United Kingdom", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43722096
Legos nwere ijiegbezu 1315, ntọ 392
Ndị uweojii na Legos ekwuola na e nwere mkpamkpa ndị omekeome 2,066 na steeti ahụ n'afọ anọ.
2018-04-11T06:41:13Z
Legos nwere ijiegbezu 1315, ntọ 392
Edgal Imohimi Kọmishọna ndị uweojii na Legos steeti bụ Edgal Imohimi kwuru na ha ebelatala ike ndị otu badoo na-akpa n'Ikorodu Kọmishọna ndị uweojii na Legos bụ Edgal Imohimi kwuru na e nwere ijiegbeezu 1315, mwakpo ndị otu nzuzo 359, nakwa ntọ 392 na steeti ahụ n'afọ anọ. Imohimi, onye kwupụtara nke a na ọgbakọ nchekwa nke Legos steeti nke e mere na Legos kwuru na a nwụchiri ọtụtụ a na-enyo enyo na ha bụ ndị omekeome, ebe ikpe ha ikpe ka na-aga n'ihu. O kwuru na ndị uwe ojii belatara ike ndị otu nzuzo a kpọrọ 'badoo,' akpa na mpaghara Ikorodu nakwa ndị isiekewọnwụ n'obodo dị na ikpere mmiri na steeti. Ngwaagha ndị uweojii napụtara ndị mmadụ Melaye chọrọ ịgba onyeisi uweojii akwụkwọ London: ụmụ ntorobia itoolu anwụọla O kwuru na ọ bụ nkwado ngwa ọrụ sitere na enyemaka nke gọọmentị Legos steeti mere ka ndị uwe ojii nwelie ike ime nke a. O kwukwara site na enyemaka ndị nchekwa obodo na njikọaka o hibere kemgbe ọ malitere ọrụ na steeti ahụ. Ọ kpọrọ oku ka agawanye n'ihu inwe ọrụ nchekwa gbanyere ụkwụ na nchọpụta nakwa enyemaka ndị eze ọdịnala nakwwa ọzụzụ ndị ọrụ nchekwa ka ọrụ ha were na-aga siririwerere. Akụkọ ga-amasị gị: Ndị Fulani na-achi ehi egbuola mmadụ 2,000 Nkwa asaa Buhari kwere na ihe o mere Yulia Skripal adịla mma
[ "Legọsị", "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Legọsị steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43723465
Akụkọ kachasị taa: Zuckerberg arịọla mgbaghara
Mark Zuckerberg arịọla mgbaghara maka ihe ndị ụlọọrụ Cambridge Analytica ji Facebook mee.
2018-04-11T07:43:46Z
Akụkọ kachasị taa: Zuckerberg arịọla mgbaghara
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Ncheta Ikpeazụ Achuzia Achuzia, otu n'ime ndị ndu agha Biafra nwụrụ ka ọ gbara afọ iri itoolu E mere abalị ncheta ikpeazụ nke dike Biafra bụ kọnel Joseph 'Hannibal' Achuzia n'Enugwu ụnyaahụ. A na-akwadokwa ime ọzọ n'Owere nakwa Asaba, taa na echi, tupu elie ya n'ụbọchị Satọde. Cheta na Achuzia nwụrụ ụbọchị 26 nke ọnwa Febụwarị 2018, ka ọ dị afọ 90. Mpụ dị na Legọs Kọmishọna ndị uweojii na Legos steeti bụ Edgal Imohimi kwuru na ha ebelatala ike ndị otu badoo na-akpa n'Ikorodu Kọmishọna ndị uweojii Lagos steeti bụ Edgal Imohimi, kwuru na site n'afọ 2014 ruo ugbua, Legọs enwetala ọtụtụ okwu gbasara ndị omekome. O kwuru na e nwere mwakpo ndị ojiegbeezu otu puku, narị atọ na iri na ise, (1315) nke ndị otu nzuzo narị atọ na iri ise na itoolu (359), nakwa ntọ narị atọ na iri itoolu na abụọ (392) na Legọs n'ime afọ anọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị Legos nwere ijiegbezu 1315, ntọ 392 Anambara esonyela na ndị emepụta mmanụ? Liverpool awụọla Man City n'ala Nyocha Facebook Mark Zuckerberg bidoro Facebook n'afọ 2004 Onye nwe Facebook bụ Mark Zuckerberg, arịọla mgbaghara maka ịhapụ ka ndị ụlọọrụ Cambridge Analytica na ụfọdị ndị ọrụ na mba Rọshịa were Facebook mee ihe masịrị ha. O kwuru nkea ka ndị sineeti Amerịka gbara ya ajụjụ ọnụ maka ihe gbasara ihe ndekọ (data) ndị mmadụ. N'egwuregwu Afọ 2007-08 bụ ikpeazụ Liverpool ruru agba nke anọ n'asọmpị Chamions League Ndị otu AS Roma nyụrụ Barcelona anya ka ha ji mkpokọta ọkpụ anọ asatara otu (4-1) gbapụ ha na Champions League. Ebe Liverpool ji mkpokọta ọkpụ ise asatara otu (5-1) gbapụ Manchester City n'otu asọmpi ahụ. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Ihe onyonyo taa Ụmụ Naịjirịa ekwupụala uche ha gbasara nkwupụta onyeisiala Buhari na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'afọ 2019.
[ "Naijiria", "West Africa", "Bọọlụ", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43731551
Akụkọ kachasị taa: Naịjirịa eruola nde 200
Naịjirịa ga-abụ mba nke asaa kachasị n'ọnụọgụgụ n'ụwa niile ma ọnụọgụgụ ya rue nde 200.
2018-04-11T17:22:26Z
Akụkọ kachasị taa: Mmadụ 257 anwụọla n' Ọlgeria
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Ọnụọgụgụ Naịjirịa na-achụ nde narị abụọ Akụkọ apụtala na ọnụọgụgụ Naịjirịa chọrọ iru mmadụ nde nari abụọ. Nke a bụ ọnụọgụgụ ọhụrụ otu na-ahụ maka ọnụọgụgụ na Naịjirịa bụ National Population Commission wepụtara. Nke a ga-eme Naịjirịa mba asaa kachasị n'ọnụọgụgụ n'ụwa niile. Akụkọ kachasi taa: Ipob nabatara Buhari 2019 Akpụpụla onye Denmark gburu nwunye ya na nwa ya na Legos ụlọikpe Akpụpụla Peter Nielsen ụlọikpe dị na Lagos Ọ bụ nwoke onye Denmark gburu nwunye ya Zainab na nwa ya nwaanyị ya akpọrọ Petra dị afọ atọ na Legos. Ụgbọelu ndị agha Algerịa kpọkasịrị taa. Ihe ruru mmadụ 257 anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu ndịagha mere taa na mba Algeria. Ndị ọrụ mịnịstrị na-ahụ maka nchekwa n'Algeria kwuru na ndị ahụ nwụrụ nọ n'ụgbọelu na-ebu ndị agha tupu ụgbọelu ahụ akpọkasịa taa. N'egwuregwu N'asọmpi Uefa champịọns ụnyaahụ, ihe ịtụ n'anya mere Barcelona mgbe ndị Roma gbapụrụ ha n'asọmpi Uefa champịọns. Ndị Barcelona jiri ọkpụ anọ asatara otu merie Roma n'ụkwụ mbụ nke asọmpi ahụ, ebe Roma n'ihe iju anya jiri ọkpụ atọ chara acha merie ma gbapụ ha. Ajụjụ a bụrụ, ihe mere ndị Barcelona onwere ike ime ndị Real dịka ha ga-ezute ndị Juventus n'abalịa. N'aka nke ọzọ, Bayern Munich ga-ele ndị Sevilla bụ ndị ha jiri ọkpụ abụọ asatara otu merie n'ụkwụ nke mbụ ọbịa n'ụkwụ nke abụọ taa. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Ihe onyonyo taa Nwaanyị mụrụ ejima atọ mana ọ maghị ebe di ya nọ kamgbe ọnwa Disemba afọ 2017. Akụkọ ndị ga-amasị gị Nkwa asaa Buhari kwere na ihe o mere 'Wepụ aha IPOB dịka 'otu oyiegwu' Dokịnta atụọla ụmụnwaanyi 11 ime
[ "Ezinụlọ", "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ụmụaka", "Mberede njem ụgbọelu", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/43736954
Ndụ Winnie Madikizela-Mandela
Ka ndị Saụt Afrịka na-akwanyere Winnie Madikizela-Mandela busoro ịkpa oke agbụrụ agha, BBC na-egosi ihe mere na ndụ ya.
2018-04-12T10:10:17Z
Ndụ Winnie Madikizela-Mandela
Ka ndị Saụt Afrịka na-akwanyere Winnie Madikizela-Mandela busoro ịkpa oke agbụrụ agha ka ọ nwụrụ n'afọ 81, BBC na-egosi ihe mere na ndụ ya.
[ "Omume", "South Africa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43736423
Kedu ihe ndị egwuregwu Afịrịka ji agbafu?
Ọ bụ ihe ama ama na ọtụtụ ndị egwuregwu n'Afịrịka gara ala bekee maka egwuregwu dị icheiche na-agba ọsọ.
2018-04-12T14:07:11Z
Kedu ihe mere ndị egwuregwu Afịrịka ji agbafu n'ofesi?
Arcangeline Fouodji Sonkbou Ndị ọrụ Kamerun kwuru na Arcangeline Fouodji Sonkbou bụ onye na-ebuli igwe so na ndị egwuregwu na-efu Ụnyaahụ bụ ụbọchị 11 n'ime ọnwa Maachị, ndị otu mba kamerụn kwuru na ha na-achọ ndị egwuregwu ha a ruru 8 so ga Australia maka egwuregwu Commonwealth. Ha kwukwara na ọ dịka ndị a "gbafuru" ma kwuo na ha agwala ndị uweojii mba Australia maka ihe a mere. BBC Igbo kpọrọ ndị egwuregwu dị icheiche maka ị chọpụta ihe mmere ọtụtụ ndị egwuregwu na-agbafụ oge niile ha gara ala bekee maka i so n'asọmpị egwuregwu ọbụla. Asọmpi Commonwealth: Ndị Cameroon 8 'agbafuola' Madrid na Bayern abaala ọkara-ikpeazụ Asọmpi Commonwealth: Naịjirịa agafeela na tenisi Onye ọgba bọọlụ Super Eagles n'oge gara aga bụ Emmanuel Babayero gwara BBC na ihe a na-eme maka ndị a ahụghị ala nna ha n'anya. Mmadụ asatọ n'ime otu ndị Cameroon ka ha na-achọ achọ N'ọnụ okwu ya: "gọọmentị ala dị icheiche n'Afịrịka kwesiri ị na tinye n'ime obi ndị mmadụ ihunanya gbasara ala ha." Mana Enefiok Bassey bụ onye nkuzi ndị obu igwe nwere atụmatụ ọzọ ọ sị bụ ihe patara ihe a. O kwuru n'ugbua ndị egwuregwu n'Afịrịka na-ata ezigbo ahụhụ. Bassey kwuru na: "ọtụtụ n'ime ndị egwuregwu a enweghị ego ị rị nri ọbụla, ya mmere oge ọbụla ha nwere ohere ị ga ala bekee maka egwuregwu ọbụla ha na-agbafu." Usoro dị mma ị ga-esị eme ya Otu onye na-agbasa ozi gbasara ihe egwuregwu bụ Niran Adesanya kwuru na onye egwuregwu ọbụla chọrọ ịnọchite anaya mba ọzọ, nwere ike ime ya site na n'usoro igafe nke Bekee kpọrọ "defection". Adesanya kwuru na: "ihe a ga-abụ nkwerikọta otu egwuregwu ala ha na ala ndị ọzọ nwere. Ọ ga-abụkwa nke a tinyere aka n'akwụkwọ. Ihe a bụ ihe ha na-eme eme." Akụkọ ndị ga-amasị gị: Obiano ga-eme ụlọ agha Ojukwu ebe nkiri Buhari adọtịala ụbọchị nkwupute ihe onye nwere
[ "Otu Commonwealth", "Egwuruegwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/43735891
'Ṅomie nụ nna unu Joe Achuzia'
Onyeisi ọhaneze Ndigbo adọọla ụmụ dike Biafra bụ Joe Achuzia aka na nti sị ha soro nzọụkwụ nna ha.
2018-04-13T06:23:17Z
Nnia Nwodo: Ṅomie nụ nna unu Joe Achuzia
Joe Achuzia Joe Achuzia sọ na ndị ndu ndị agha Biafra nke a lụrụ bido n'afọ 1967 rue afọ 1970 Mgbe akụkọ ọnwụ onye agha Biafra ma bụrụkwa dike ndị Igbo bụ Joe Achụzia batara n'obodo,owutere ọtụtụ mmadụ mana ha kasiri onwe ha obi maka ụdiri ndụ o biri. Tumadị na imee ka ndị Igbo nwere onwe ha. Nnia Nwodo bụ onye isi Ohaneze ndị Igbo gwara ụmụ dike Biafra bụ Joe Achuzia ka ha gbaa mbọ hụ na ha soro nzọụkwụ nna ha. O kwuru nke a ka e mere emume ncheta ikpeazụ Achuzia n'Asaba ụnyaahụ. Joe Achuzia: Ihe ị na-amaghị maka ya Ebidoola akwamozu Kọnel Joe Achuzia Ndị agha Biafra Nwodo gwakwara ndị Igbo na ike agwụla ha n'ime ndọrọndọrọ maka ị nweta ọnọdụ ọma n'ala dimma ebe ndị obodo ahu ga-enweta ikike nhataha n'agbanyeghị ebe ha si. O kwuru na ha mee nke a, na ọ ga bụ nnukwu nkwanye ugwu dinyere Achuzia. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Obiano ga-eme ụlọ agha Ojukwu ebe nkiri 'Wepụ aha IPOB dịka 'otu oyiegwu' Ipob: Mpụtagharị Buhari ga-enye anyị Biafra
[ "Naijiria", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43765267
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ncheta ụmụakwụkwọ Chibok
Naịjirịa na mba ụwa na-echeta afọ anọ atọọrọ ụmụakwụkwọ Chibok n'aka ọzọ mba Amerịka, UK na Fransị atụọla ogbunigwe na Sirịa.
2018-04-14T09:54:52Z
Taa bụ afọ anọ atọọrọ ụmụakwụkwọ Chibok
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Taa bụ ncheta afọ anọ atọọrọ ụmụakwụkwọ Chibok N'ụbọchi taa, Naịjirịa na otu dị iche iche na mba ụwa niile dịka UNICEF, BBOG na-echeta afọ anọ atọrọ ụmụ akwụkwọ Chibok dị narị abụọ na iri asaa na isii. Cheta n'abalị iri na anọ nke ọnwa Epurelu n'afọ 2014 ka ndị Boko Haram tọọrọ ụmụaka ndị a n'ụlọ akwụkwọ ha dị na Chibok nke Borno Steeti. Atọọrọ ụmụakwụkwọ Chịbok n'abalị iri na anọ nke ọnwa Epurelu n'afọ 2014 Ndị Afara Ukwu Ibeku, Abia Steeti Ahụbeghị onye Eze ha Praịm mịnịsta ọdịnala nke Ụmụobasi,Isiama Afara Ukwu bụ Chiemelam Odoemelam etiela na mkpu na ndị obodo ha ahụbeghị onye Eze ha bụ Isreal Okwu Kanu nna onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu. Ọ rịọrọ ka ndị ji ya na ezinaụlọ ya kpọpụta onye Eze ha ma ọ dị ndụ ma ọ ọnwụrụ anwụ Ndị agha Naịjirịa wakporo ezinaụlọ Obieze Eze Isreal Okwu Kanu bu nna Ipob bụ Nnamdi Kanu Akụkọ ndị ga-amasị gị: Oruola afọ anọ eji tọrọ ụmụaka Chibok Trump akatọọla ogbugbu ndị mmadụ na Sirịa Ụmụ Igbo chị ọkụ n'asọmpị Commonwealth Mba Amerịka, Uk na Fransị atụọla ogbunigwe na mba Sirịa Mba Amerịka , United Kingdom na Fransị agbakọtala aka ọnụ tụọ ogbunigwe n'ụlọọrụ ebe a na-eme ngwaagha kemịkal na mba Sirịa, maka mwakpo ha jiri ngwaagha ahụ mee n'obodo Douma. Ogbunigwe a gbara n'isi obodo Sirịa bụ Damascus, nakwa obodo abụọ ọzọ dị na mpaghara Homs. Ogbunigwe mịzaị mba Fransị dịka ọ na-efepụ N'egwuregwu N'abalị ụnyaahụ, ụmụ afọ Naịjirịa zakọọrọ nrite ọlaedo anọ nke mere ya ọlaedo asatọ ha nwetarala n'egwuregwu commonwealth. Naịjirịa bụ ndị abụọ kachasị enweta ihe nrite na Afrịka ma agụpụ mba Saụt Afrịka. Ụmụ Naịjirịa na-anọchite Naịjirịa n'egwuregwu ahụ Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Ihe onyonyo taa Ihe onyonyo a gosiri ahụhụ ndị ụmụaka bụ ụmụ ndị China na-ata na Ghana.
[ "Syria", "United Kingdom", "Naijiria", "France", "Amerika", "Nnamdi Kanu", "Ntọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43773971
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Anyị na Salkida anaghị arụkọ.
Gọmmentị Etiti sị na ha anụbeghị akụkọ maka ọnwụ ụmụakwụkwọ Chibok,Donald Trump adọrọ Gọọmentị Sirịa aka na ntị.
2018-04-15T08:33:23Z
Gọọmenti Etiti: Anyị anụbeghị akụkọ maka ọnwụ ụmụakwụkwọ Chibok
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Gọọmenti Etiti: Anyị anụbeghị akụkọ maka ọnwụ ụmụakwụkwọ Chibok Ụfọdụ ụmụakwụkwọ Chibok atọghapụrụ n'agbụ na-agụzị akwụkwọ na mahadum dị n'Amerịka Gọọmenti etiti agọnarịla akụkọ Ahmed Salkida wepụtara nke kwuru na ọ bụ naanị mmadụ iri na ise n'ime ụmụakwụkwọ Chibok otu narị na iri na abụọ eji eji ka dị ndụ Onye ndụmaọdụ onyeisiala na mgbasa ozi bụ Malam Garba Shehu kwupụtara nke sị na aka Ahmed Salkida adịghị na mkparịta ụka ịtohapụ ụmụaka ndịa. Nwaanyị zutere ọnwụya n'akwamozu ọ gara n'Enugwu Steeti Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amaraizu kówara na ndị uweojii na-enyocha ihe mberede ahụ mere Ihe mgbawa obi emela mgbe onye bịara ịkwa ozu soro ozu laa mụọ. Otu nwanyị akpọrọ Ngozi Eze zutere ọnwụya dịka otu nwoke otu nwoke bụ Daniel Chukwu jiri egbe gbagbuo ya n'amaghị ama. Nke a mere na Amanato mburumbu dị na Nkanu west nke Enugwu Steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Oruola afọ anọ eji tọrọ ụmụaka Chibok Mba Amerịka, UK na Fransị awakpola Sirịa Ụmụ Igbo chị ọkụ n'asọmpị Commonwealth Donald Trump adọọla Gọọmentị mba Sirịa aka na ntị Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla ndị gọọmenti Sirịa aka na ntị na ha ndị na njikere ịtụ ogbunigwe ọzọ ma ọ bụrụ na o sepụghi aka n'iji ngwaagha kemịkal awakpo ndị mmadụ. Ebe gọọmenti mba Sirịa ekwuola na aka ha adịghị na ngwaagha Kemịkal na ọ bụ ndị agha nnupiisi boro ha ebubo ime mwakpo ahụ. N'egwuregwu Hawkins gara inweta ọlaedo ma ọbụrụ na ọ gbara ọsọ rue n'isi Ohere irite ọlaedo n'ịgba ọsọ ikeagwụnwamkpị n'egwuregwu Commonwealth akwala otu nwoke bụ Callum Hawkins nwafọ Scotland. Hawkins dara n'ala ugboro abụọ dịka ọ fọdụrụ nkeji abụọ ka o merie n'ọsọ ahụ nke mere onye ọzọ jiri rite ọlaedo ahụ. Nkeji nke mgbede a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Ihe nkiri nke taa N'ihe nkiri a, Sịnetọ Enyinnaya nke Abia Steeti kwuru na ndị ọchị ehi chọrọ ị napụ ụmụ afọ Naịjirịa ala ha n'ike
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Donald Trump", "Ntọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43780045
Agbalịkwaranụ m- Buhari
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari kwuru na e lee anya n'ọnọdụ dị oge ọ banyere n'ọkwa ọchịchị na ya agbalịala.
2018-04-16T10:56:02Z
Buhari: Ị lee anya n'ọnọdụ dị oge m bịara, agbalikwaranụ m
Buhari Muhammadu Buhari gara njem ọrụ na Lọndọn Dịka ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Femi Adesina si kọwa: "Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola na e lee anya n'ọnọdụ ọchịchị ya kwudoro n'ala anyị, na enweghị ego e dowere, e mefuchara akụnaụba anyị, ọ gbaliịkwaranụ." Adesina sị na Buhari kwuru nke a na Londọn oge ọ nabatara otu ndị nkwado ya nọ na mba ofesi nke a kpọrọ,"Buhari Diaspora Support Organization' na bekee nke onye ndu ha bụ Charles Efe Sylvester. Buhari kwụrụ n'ọbụ ndị ajọ mmadụ kwariri akụ ala Najiria ma mee ka ndị obodo anyị daa ogbenye. Mana okwu a Buhari kwuru kpara ọtụtụ ndị Naijiria iwe nke ha gosiri na sochal midia: Onyeisiala na-ekwu na ya gbalịrị, mana mmadụ a na-elele onwe ya ule? O mezuru nkwa ya na otu pati ya bụ APC kwere ndị Naijiria nke ha gbadoro ukwu were tunyere ya votu n'afọ 2015? Kedụ ihe o merela ha n'ime nkwa ndị o kwere? Buhari: Aga m azọ ọchịchị 2019 Chụaranụ Naịjirịa aja -Buhari Isiokwu di n'akwụkwọ Obasanjo degara Buhari BBC Igbo lenyere anya n'asaa n'ime nkwa o kwere iji tulee ndị o mere na ndị o meghị: I. Ibuso mmerụaka agha Ihe o mere: EFCC napụtara ọtụtụ mmadụ e boro ebubo mmerụaka nnukwu ego na ụlọ mana o nwebeghị onye ụlọikpe mara ikpe maka mmerụka. Onyeisiala na nzukọ ndị isi otu APC mere ụbọchị Monde ebe ọ nọ kwupụta na ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ n'afọ 2019 N'aka nke ọzọ, ndị pati ndị ọzọ na-ebo Buhari ebubo na ọ bụ sọsọ ndị esonyeghị na pati ya ka a na-anwụchi maka mmerụaka. 2. Ibuso Boko Haram agha iji nwe ezi nchekwa O belatara mkpamkpa Boko Haram ma nata ha obodo ndị ha kpaara dịka nke ha. N'aka nke ọzọ, nchekwa obodo ka na akpụ afọ n'ala n'ihi na ndị Fulani na-achị ehi egbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgbaghara dị na-etiti ha na ndị ọrụugbo. 3. Inye ọrụ dị 720,00 kwa afọ Ihe o mere: Kama inye ọrụ dịka Buhari siri kwe na nkwa ma rotekwara ndị mmadụ oge ọ biara na Legos nsonso, a chụrụ mmadụ ruru nde anọ n'ọrụ. 4. Imachi ndị ọrụ gọọmenti ịga mba ofesi maka ọgwụgwọ ọrịa Ihe o mere: Buhari amachighị ya dịka osi kwe na-nkwa, kama, ya onwe, na nwa ya nwoke bụ Yusuf gara mba ofesi maka ịnata ọgwụgwụ. 5. Otu nri n'ụbọchị maka ụmụaka Prịmarị nke gọọmentị Ihe o mere: E bidola atụmatụ a na nanị steeti iri na anọ: Anambara, Enugwu, Oyo, Osun, Ogun, Ebonyi, Zamfara, Delta, Abia, Benue, Plateau, Bauchi, Kadụna na Taraba. Mana ụfọdụ ndị ọrụ obodo kwụụru onwe ha sị na N70.00 maka otu nrị anaghị enye nri nwere isi. 6. Ịrụ mahadum nka nna ụzụ isii Ihe o mere: A rụbeghị ọbụladi otu. 7. Ime ọkụ latrik ka ọ gbalite rue 20,000 megawat n'afọ anọ Nke a bụ maka iji mee ka ọkụ na-adị mgbe niile. Ihe o mere: Dịka Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ bụ Babatiunde Fashola siri kwuo,Naijiria enwetarula 7000 megawat. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ipob: Mpụtagharị Buhari ga-enye anyị Biafra 'Wepụ aha IPOB dịka 'otu oyiegwu'
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43781296
Ihe ị maghị maka ọgbakọ 'Commonwealth'
Ndị na-achị mba dị icheiche na Commonwealth na-enwe nzụkọ ugbua na London, BBC na-eleba anya n'ihe pụrụiche maka ọgbakọ a.
2018-04-16T12:14:24Z
Commonwealth: Ihe asaa ị na maghị maka ya
Ezenwaanyị mba Britain gara India n'afọ 1997 Ka ndị mba Commonwealth na-eme nzụkọ, lee ihe asaa ị maghị maka ọgbakọ a. 1) Otu ụzọ n'ụzọ atọ n'ime mmadụ niile nọ n'ụwa bi n'ime mba Commonwealth dị icheiche Ihe ruru mmadụ ijeri 2.4 n'ime mmadụ ijeri 7.4 n'ụwa niile bi na mba ndị Commonwealth. Ụfọdụ ha erụbeghị afọ iri atọ. Mba kachasị n'ọnụọgụgụ bụ mba India nke mezuru ọkara ọnụọgụgụ a. 2) Mba Britain achịghị ọtụtụ n'ime ha n'oge gaara aga Belgium na Germany chịrị Rwanda mana UK achịghị ha Rwanda na Mozambique banyere n'afọ 2009 na 1995 ma o nweghị nke mba Britain chịburu. O nwekwara ndị sị n'otu a pụọ: Robert Mugabe kpọpụrụ ala Zimbabwe n'afọ 2003, a chụpụrụ Pakistan n'afọ 1999 ma nabatakwa ha mgbe afọ anọ gachara. Mba South Afịrịka pụrụ mgbe a katọrọ oke ha na-akpa n'etiti ndị ọcha na ndị ojii Mba ikpeazụ pụrụ na Commonwealth n'afọ 2016 bụ Maldives. 3) Ezenwaanyị Britain na-achị mba iri n'isii n'ime ọgbakọ a Ọtụtụ mba Commonwealth bụ Repọblịk, sọsọ isii n'ime ha Lesotho, Swaziland, Brunei Darussalam, Malaysia, Samoa na Tonga nwere eze nke ha. Tonga nwere eze nke ya bụ Tupou VI (etiti) 4) O hiri nne Mba ndị Commonwealth mezụrụ otu n'ime ọkara anọ ala dị n'ụwa niile. Mba kachasị bụ Canada. India na Australia hịkwara nne mana ọtụtụ n'ime ha dị obere dịka Nauru, Samoa, Tuvalu na Vanuatu, na Dominica kwa. Canada riri nne Nauru dị obere 5) Ọ gbanwela aha ya mbụ Ndị ọchịchị Commonwealth nwekwara nzụkọ n'afọ 1969 Ọgbakọ Commonwealth a bụ nke ọhụrụ a gbanwere n'afọ 1949 mgbe e wepụrụ "British" na aha ya. Sọsọ mmadụ abụọ chịrị otu Commonwealth ahụ mana ọ bụghị kwa ihe nna na-enye nwa ya mana a na-atụ anya na nwaeze Charles ga-arịgo ọkwa ọchịchị a mgbe ọ bụrụ eze. Mba ndị bidoro otu na mbụ bụ Australia, Canada, India, New Zealand, Pakistan, South Africa, Sri Lanka na mba Britain. 6) Mba Britain ka nwe ahịa kachasị... India nwereike ị gafe UK n'afọ a. GDP achịkọtara ọnụ ndị mba 53 a ruru $10tn (£7tn). O fọdụrụ obere ihe ka ya na nke China ha nhata nha, ebe nke ha bụ ($11tn, £7.7tn). 7) Commonwealth dị karịa otu. Commonwealth nke mba nwere onwe nwere nzụkọ na Minsk, Belarus Echezọna ngalaba ndị mba French na Commonwealth mba ndị nwereonweha a kpọrọ CIS na-aha ịchafụ mba ndị Soviet ochie bidoro n'afọ 1991. Akụkọ ga-amasị gị: Agbalịkwaranụ m- Buhari 'Sọ ndiohi ga-abụnwu onyeisiala Naịjirịa'
[ "Otu Commonwealth", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43786646
E jim asụsụ Igbo agụgharị egwu ndị mmadụ - Josh2funny
Josh2Funny na Soshal Midia, gwara BBC na kamgbe o bidoro mewe ihe ịkpachọchị n'instagram, ihe dị iche adila na ndụ ya.
2018-04-17T07:01:21Z
Soshal midia emeela m ọgaranya - Josh2funny, onye ọchị
Chibuike Josh Alfred, bụ onye ejiri Josh2Funny mara, gwara BBC na kamgbe o bidoro mewe ihe ịkpachọchị n'instagram,ihe dị iche adila. O gwakwara anyị ihe mere o ji agụgharị egwu ndị mmadụ n'ụzọ na-atọchị.
[ "Omume", "Ihe nkiri", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43817668
Amarachi Atama: Asụsụ Igbo ga-adịgide
Amarachi Atama bụ nwaada Igbo ama ama na-agba mbọ maka nchekwa asụsụ Igbo maka na ọ chọghị ka ya bụ asụsụ larie.
2018-04-19T08:54:17Z
Asụsụ Igbo agaghị anwụ
Amarachi Atama bụ nwaada Igbo ama ama na-agba mbọ maka nchekwa asụsụ Igbo makana ọ chọghị ka ya bụ asụsụ larie. Ọ gwara BBC Igbo mkpa ọ dị iji hụ na asụsụ Igbo kwudosiri ike.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43814821
Sinetị akwụsịla akwụkwọ iwu ntuliaka
Ndị ụlọọrụ sineti ewezugala akwụkwọ iwu ntuliaka afọ 2010 nke na-eleba anya n'ịwegharị usoro ntuliaka.
2018-04-19T09:13:36Z
Sinetị akwụsịla akwụkwọ iwu ga-awụgharị usoro ntuliaka
Saraki na Ekweremadu Onyeisi sineti bụ bukola Saraki anọghị oge mwakpo ahụ mere Akwụkwọ iwu ahụ nke chọrọ iwegharị usoro ntuliaka kwadoro ịgafe agba ọgụgụ nke abụọ na sinetị mana o nwere ọgbatauhie dịka ọtụtụ ndị omeiwu rụtụrụ aka n'akụkụ dị icheiche n'akwụkwọ iwu ahụ nke ha kwauru nwere ntụpọ. Ndị omeiwu ahụ kwekọrịatara ka ahapụgodi yabụ iwu ma gwa otu kọmịtị na-ahụ maka ntuliaka ka ha wepụ akụkụ ebe ndị ahụ na-edoghi anyị nke mere na onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyeghi aka na ya. Akụkụ ndị onyeisiala kwadoro, a ga-eweghachiri ya ka o binye ya aka. Akụkọ ka na-abịa... Akụkọ ga-amasị gị: Etu ndị Sinetọ si agbari ego Naijiria Akụkọ kachasi n'abalị a A nwụchiela sinetọ Ovie Omo-Agege
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ikpe", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43819565
Iwe okwu Buhari na-ewe ndị ntorobịa
Ndị ntorobia Naijiria eweela iwe n'ihi okwu Onyeisiala Buhari kwuru na ha dị umengwụ.
2018-04-19T09:42:57Z
Iwe okwu Buhari na-ewe ndị ntorobịa
Muhammadu Buhari Buhari gara njem ọrụ na London kemgbe izu gara aga Ndị ntorobịa Naijiria gosiri iwe ha n'ihe onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru n'ọgbakọ Commonwealth e nwere na Westminister, Lọndọn, ụbọchị Wenesde ebe o kwuru na ndị ntorobịa Naijiria adịghị ike ọrụ. Buhari sị: "Pasentị iri isii n'ime mmadụ dị nde 180 n'ọnụọgụgụ, erubeghị afọ iri atọ ọtụtụ n'ime ha agabeghị akwụkwọ, ha na-ekwu na Naijiria bụ mba na-emepụta mmanụ ya mere na ha ga-etukwuru ala na enweghị ihe ha na-eme, ma na enweta ebe obibi, nleta ahụike na agụmakwụkwọ na-e akwụghị ego ọbụla." Mana okwu ahụ kpasuru ọtụtụ ndị ntorobịa iwe nke ha kwuputara na soshal midia. Onye na-eme ihe nkiri ma bụrụkwa onye zọrọ ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti bụ Yul Edochie, sara onyeisiala na Twitter sị: "Anyị adịghị umengwụ." Onye ọzọ kpọrọ onwe ya, Maazị Jack Robinson, kwuru na "dịka onye ntorobia Naijiria gbalahụrụ ọnwụ erughị eru ka a mụrụ ya n'obodo kachasi dị egwu n'ụwa, ebe ụgwọọnwa opekampe a na-akwụ onyeọrụ bụ dọla iri isii ($60), na-enye onwe ya mmiri, na-enye onwe ya ọkụ, na enweghị nchekwa ahụike, ụgwọ ị ga-akwụ ya abụrụ ịgwa mbaụwa na ọ dị umengwụ". Ebe Jackson Ude kwuru na ọ bụ ihe ihere na onyeisiala Buharị, onye o kwuru na onyenwughị ndị ntọrọbia ọrụ, gwara ọgbakọ Commonwealth na ọtụtụ ndị ntorobịa Naijiria dị umengwụ. Kelly kwuru na ọ dị ezigbo njọ na Buhari kpọrọ ndị ntorobịa ndị ụmengwụ n'ihi na dịka o si kwuo, ndị mba ọzọ maara na ndị ntorobịa Naịjirịa dị ike ọrụ.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43827920
Onyeisiala agaghị akọli ụmụ Naịjirịa ọnụ
Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na onweghi ka onyeisiala ga-anọkata kọọ ụmụntorobịa Naịjirịa niile ọnụ.
2018-04-19T15:49:41Z
Onyeisiala agaghị akọli ụmụntorobịa Naịjirịa niile ọnụ
Buhari Amabeghi mgbe Buhari ga-alọa na njem o mere gaa London Onye nkwuchiteọnụ onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina edeela akwụkwọ iji katọọ akụkọ na-agagharị na onyeisiala kọrọ ndị ntorobịa Naịjirịa ọnụ na ha achọghị ịrụ ọrụ. Akụkọ ahụ pụtara ụnyaahụ ka onyeisiala nọ na mkparịaụka na ajụjụ na azịza nke ha mere ka e mesiri ọgbakọ ndị Commonwealth na London kwuo na ụfọdụ ụmụ Naịjirịa anaghị achọ ịrụ ọrụ maka na Naịjirịa na-emepụta mmanụ. Ụmụ Naịjirịa buru akụkọ a n'igwe sọshal midia niile dịka ndị mmadụ na-ahụta ya dịka mkparị nye ụmụntorobịa Naịjirịa niile. Okwu atọ Buhari ji 'wụọ Naịjirịa n'ala' Ihe ị maghị maka ọgbakọ 'Commonwealth' Iwe okwu Buhari na-ewe ndị ntorobịa Mana n'akwụkwọ ahụ nke Femi Adesina dere, o kwuru na onweghi oge ọ ga-abụ mmasị onyeisiala Naịjirịa bụ nna Naịjirịa niile nakwa nwere ụmụ nke afọ ya ịkọ ụmụ Naịjirịa ọnụ. Adesina kwuru na ọ bụ nghọtaghie ka a ghọtaghiere ihe onyeisiala kwuru ebe ọ rụrụ aka na ndị omekome burukwara akụkọ a n'ụzọ na-ezighiezi. O kwuru na onyeisiala Buhari na-eto ụmụ Naịjirịa na-eme nkeọma na ngalaba dị icheiche oge niile ma ọ ga na-aga n'ihu na-emekwa nke a maka na ọ ma na ha nọ n'etiti ndụ Naịjirịa. N'okwu ya, Onyeisiala Buhari kwuru; "Anyị nwere ndị ntorobịa karịọ́ n'ọnụọgụgụ, ọnụọgụgụ anyị dị ebe nde mmadụ 180 ma pasentị 60 n'ọnụ ọgụgụ ahụ dị afọ pekarịrị 30, Ọtụtụ nime ha agabeghi akwụkwọ mana ha na-ekwu na Naịjirịa bụ mba na-emepụta mmanụ, nke a kpatara ha ga-eji nọrọ na-emeghi ihe ọbụla ma chere aka na-aghọrọ ihe ndị dịka ụlọ, ahụike na agụmakwụkwọ n'efu." Adesina kwuru ka ndị mmanụ kwụsị iwepụ ihe onyeisiala na-ekwu jiri ya na-eme ihe ọchị maọbụ ekwugharị ya etu ọ na-apụtaghị n'ihi na ọ gaghị amịta mkpụrụ. Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari gara London maka ọgbakọ ndị mba COmmonwealth an ihe ndị ọzọ ọ chọrọ ime. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe na-akpa m bụ nchekwa na akụnaụba obodo Etu ndị Sinetọ si agbari ego Naijiria Lee onye aka ya dị n'ohi ọfọ ndị sineti
[ "London", "Otu Commonwealth", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Afịrịka", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43835096
Ntorobịa Naịjirịa amaala Buhari aka
Ndị ntorobia Naijirịa ekwenyeghị n'ihe Buhari kwuru na CHOGM na ha dị umengwụ.
2018-04-20T12:54:29Z
Ntorobịa Naịjirịa amaala Buhari aka maka ịkpọ ha 'ndị umengwụ'
Muhammadu Buhari Ndị Naịjirịa na-ekwu na onyeisiala Muhammadu Buhari na-awụ ha n'ala na mba ofesi oge ụfọdụ Ndị mmadụ ka na-etinye ọnụ n'okwu gbasara 'umengwụ' onyeisiala Naịjirịa kpọrọ ndị ntorobịa. Ka Buhari gara London maka nzukọ ndị ọchịchị mba ndị nọ n'okpuru Commonwealth nke a kpọrọ CHOGM, o kwuru na ndị ntorobịa Naịjirịa dị umengwụ. Okwu a o kwuru atọghị ọtụtụ ndị Naịjirịa ọchị, nke kpatara ha jiri gosi iwe ha n'elu sosha midia. Okwu atọ Buhari ji 'wụọ Naịjirịa n'ala' Iwe okwu Buhari na-ewe ndị ntorobịa Onyeisiala agaghị akọli ụmụ Naịjirịa ọnụ Onye na-ekwuchitere ọnụ Buhari bụ Femi Adesina, kwuru na ndị Naịjirịa ghọtaghiere ihe o kwuru. Ihe Adesina kwuru akwụsịghị ndị mmadụ ikwu ihe dị ha n'obi. "#LazyNigerianYouths" na-ewu Ọtụtụ n'ime ha gara n'ihu bido igosipụta ọrụ aka ha, ma na-ekwu na ha abụghị ndị umengwụ n'agbanyeghị na ala Naịjirịa adịchaghị mma. Otu onye ọcha tinyere ọnụ ya n'okwu a. Ụfọdụ kwuru etu ha si jiri aka ha zụọ onwe ha n'ụlọakwụkwọ site na mbọ ha na-agba. Ụfọdụ kwuru na ha agaghị ebinyere Buhari aka n'afọ 2019 Otu onye ji okwu njakịrị gosi onye nwere ọrụsị ka na-eji ya arụ ọrụ
[ "Naijiria", "Muhammadu Buhari", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43834025
Onye ga-abụ onyeisi ọhụrụ na commonwealth?
Ndị isi Commonwealth na-ezukọ ka ha wee chọpụta ma nwaeze Wales a ga-anọchite anya nne ya dika onyeisi ngalaba ahụ.
2018-04-20T14:43:11Z
Onye ga-abụ onyeisi ọhụrụ na commonwealth?
Ezenwaanyị Elizabeth Ezenwaanyị mba England chọrọ ka nwa ya nwoke Charles nọchie ya n'ọkwa Ndị isi Commonwealth na-ezukọ ka ha kparịta ụka ị chọputa ma nwaeze Wales a ga-anọchite anaya nne ya dịka onyeisi ga-chi ngalaba jikọtara obodo 53. Ụbọchị Tọsde ka Ezenwaanyị Briten kpebiri na nwa ya Charles ga-achị otu akpọrọ CHOGM na Buckingham Palace. Ọ si na ọ bụ mmasị ya ka nwa ya Charles chịa CHOGM otu ụbọchị. Mana ya bụ ọkwa abụghị ihe Ezenwaanyị na-ekenye nwa ya maọbụrụ godu na ọ nwụọ. A na-tụ anya na ndị isi oche Commonwealth ga-ekpebi maka onye ga-achị ha ma ha zukọ na Windsor Castle mana enwebeghị ihe gosiri na a ga-ekwupụta ya bụ ihe na nzukọ ahụ. Ọ bụ na-enweghị onye ọzọ nwereike ichi commonwealth? Onye ntaakụkọ BBC bụ James Landale sị na atụọla arọ ka ọkwa ahụ na-agagharị n'etiti ndị isi obodo nọ na Commonwealth. Mana, Onyeisiala Saut Africa Cyril Ramaphosa egbubirila ije ya na nzukọ a na-eme na London ka owere mara ihe kpatara mwakpo a na-eme n'obodo ya. Mwakpo a na-eme n'ugwu Saụt Afrịka ebe ndị ngagharị iwe na-asị ka-enye ha ọrụ, ụlọ obibi na nkwụsị mmerụaka. Kedu ihe bụ ọrụ onyeisi Commonwealth? Ọkwa nke Ezenwaanyị Briten nọ na ya dị oke mkpa. Ngalaba a na-achịkọta mba iri ise na atọ iji wee hụ na ihe njirimara Commonwealth bụ ihe bịara na mmezu. Nke a gụnyere ijikọta mba ndị a site n'azụmaahịa na mmekọrịta mba ụwa niile. Akụkọ ga-amasị gị: Chimamanda sị na onwere onye wakporo ya Onyeisiala agaghị akọli ụmụ Naịjirịa ọnụ Ntorobịa Naịjirịa amaala Buhari aka Onyeisi otu ndị a na-eme njem nleta na mba niile nọ na otu ahụ, iji mee nkwekọrịta ahụ guzosie ike. O bụ ndị isi otu a na-eme mkpebi onye ga-abụ onyeisi ha gbagburugburu. Praịm Mịnịsta bụ Theresa May na Praịm Mịnịsta mba Canada bụ Justin Trudeau akwadola ọkparaeze Charles ị bụ onyeisi. Gịnị bụ CHOGM? CHOGM bụ Commonwealth Heads of Government Meeting n'asụsụ bekee. Ọ bụ ọgbakọ ndị ndu mba ndị so n'otu commonwealth, nke a na-eme kwa afọ abụọ. Ndị na-eme ya bụ ndị isiala na ndị Praịm Mịnịsta mba dị iri ise na atọ na ndị ezinaụlọ ha, ndị na-ekwuru ha okwu na ndị ntaakụkọ. Ọgbakọ nke afọ mere na Lọndọn, ebe nke gara aga n'afọ 2015 bụ na Valletta dị na Malta.
[ "Queen Elizabeth II", "United Kingdom", "Naijiria", "Canada" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43841475
Ihe eji atụ ụtụ naira 3000 n'Imo
Gọọmentị Imo steetị na-ekwu na atụmatụ ụtụ a esịghị ha n'aka, mana ha ga-eji naira nde iri akwado ya.
2018-04-20T16:03:19Z
Ego a na-atụ n'Imo agaghị aba akpa anyị - Okwuchite ọnụ Rochas
Rochas Okorocha na eze ndị Ogoni, King Godwin Gininwa Agba ọchịchị Rochas Okorocha ga-agwụcha n'afọ 2019 Ka akụkọ na-akọwa na gọọmentị Imo steeti agwala ndị okenye niile tozuru ị rụ-ọrụ ha kwụọ naira puku atọ pụtara, gọọmentị Imo na-akọwa na ọ gbụghị ha ka ego a dị mkpa. Ebere Iwuji bụ onye na-ekwuchite ọnụ gọvanọ n'ihe gbasara mgbasa ozi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ụgwọ a bụ ụgwọ a ga-akwụ nanị otu mgbe. O kwukwara na a ga-eji ego kwado ọrụ dị icheiche obodo ndị nọ n'ime Imo steeti ji aka ha na-eme. Agbanyeghị na akụkọ na-ekwu na ọ nde naira isii ka eyiri otu obodo, Nzewuji sịrị na enweghị aha ego ọbụla akpọrọ, makana ọ ndị bi na imi obodo ugbua kwesịrị ịtụ ụtụ a. Nzewuji si "Ego a gaghị abanye n'akpa gọọmentị Imo steeti, ọ bụ ngalaba obodo dị icheiche akporọ Community Government Council (CGC) nwe ya". Nzewuji gara n'ihu kwuo na gọọmentị Imo steetị ga-eji nde naira iri wee kwado obodo ọbula tụrụ ego a, ka ha na-ele anya na a ga-eje ya hiba ụlọọrụ mepụta ihe na ihe ndị ọzọ obodo chọrọ. "A nam eche na onye ọbụla chọrọ ọganiru ga-achọ ikwado ya, okachasị ebe ha na-etinye aka n'mbu na ọrụ mmepe obodo," Nzewuji kwuru. Nzewuji gakwara n'ihu kọwa na onweghị eze obodo ọbụla anapụrụ ọgwọ onwa maka ihe a. Gee nkọwa ya n'uju ebe a: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị: Ihe mere ndị Naịjịria ji enye otu ụzọ n'ụzọ iri Onyeisiala agaghị akọli ụmụ Naịjirịa ọnụ Akụkọ kachasi n'abalị a: Buhari bụ nna Naijiria
[ "Naijiria", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43848400
Kedụ otu pati ndị ga-ekpoko iwepụ APC?
Ntuliaka 2019 naha asara ọkụ dịka ụfọdụ pati na-ejikọ na-achọ iwepu APC n'ọchịchị n'afọ 2019.
2018-04-21T13:34:00Z
Kedụ otu pati ndị ga-ekpoko iwepụ APC?
Olusegun Obasanjo Olusegun Obasanjo kwusiri ọchịchị n'afọ 1999 Ọtụtụ ndị otụ pati nọ n'ọkwa ọchịchị akpọrọ APC nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa na-agba mbọ ịwepụ ọchịchị n'aka pati Buhari na 2019. Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ pati nwereike imalite ijikọ n'izuka na-abia iji wee kwusi mgbagọ ọbụla na ntuliaka na-abia nu. Ndị gunyere na njikọta pati a bụ pati ndị a: 'Peoples Democratic Party(PDP), ụfọdụ ndị isi na All progressives Congress (APC), Social Democratic Pati,' ndị obere pati ndi ọzọ ruru iri abuọ na atọ nakwa 'Coalition for Nigeria Movement (CNM) nke onye bubu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo . A malitela otu njikọ nke Obasanjo Ntuliaka 2019: Keyamo bụ onye nkwuchiteọnụ Buhari Buhari: Aga m azọ ọchịchị 2019 APC were ọchịchị n'afọ 2015 Ndị bubu onyeisiala na Naịjirịa, ndị isi agha lagoro ezumike nka gunyere onye agha T.Y Danjuma na-akwado mkpokoba a. N'ọnụ otu onye welitere isi na ya bụ mkpoko, "nke a agaghị adị ka mgbanwo mụtara pati APC. Anyị anaghị ezigara ụlọọrụ INEC aha mgbanwe. Pati ọhụrụ a ga-enye onye ọ bụla ohere ikwuputa obi ya." Ndị nọ n'ụlọomeiwu na ndị govano ruru iri na itoolu na-akwadoka ya bụ mkpokoba. PDP chịrị Naịjirịọ́ afọ iri na isii tupu APC anara ha ọchịchị N'aka nke ọzọ, pati PDP ka a na-atule ma ha ga-agbanwe aha pati ha. Onyeisi pati ahụ bu Uche Secondus kwuru na ya na ndị otu ya ka na-atule ya bụ echic Mana ndị mmadụ na-ekwu na kama igbanwe aha, pati PDP weputa ụzọ dimma dị iche iche ha ga-esi dozie ala Naịjirịa ma wepu APC n'ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe eji atụ ụtụ naira 3000 n'Imo Ndị na-anata ọgwụgwọ ejichiela ndị ọrụ ahụike Ntorobịa Naịjirịa amaala Buhari aka
[ "Olusegun Obasanjo", "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "All Progressives Congress", "Abuja", "Muhammadu Buhari", "PDP (People's Democratic Party)" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43851248
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Buhari alọtala
Onyeisiala Muhammadu Buhari alọghachitela Naịjirịa ụnyaahụ kemgbe ọ gara London maka nzụkọ ndisi mba Commonwealth.
2018-04-22T05:32:27Z
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ: Buhari alọghachitala Naịjirịa
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Onyeisiala Muhammadu Buhari alọtaala Naịjirịa. Buhari kwupụtara ebumnobi ya ịzọgharị ọkwa onyeisiala ọzọ na ntuliak 2019 Onyeisiala Muhammadu Buhari alaghachitela na Naịjirịa ụnyaahụ kemgbe ihe karịrị otu izuụka ọ pụrụ gaa London. Njem ya bụ maka ọgbakọ ndị isi mba Commonwealth nakwa mkparịtaụka ya na Theresa may nwere. Ndị ọchịehi a chọrọ ikpochapụ obodo ndị na Benue? A wakporo obodo ise n'ime Guma LGA nke Benue Steeti Akụkọ na-ekwu na ha wakporo ụfọdụ obodo dị n'okpuru ọchịchị Guma dị na steeti ahụ ụnyaahụ wee gbuo ihe ruru mmadụ iri abụọ ebe ha gbara ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ ọkụ. Mba Frans na-atụ ụjọ mkpochapụ Ọtụtụ ndị a ma ama na mba France ebinyela aka n'akwụkwọ arịọ ka etinye ọnụ n'okwu ndị na-achọ ikpochapụ otu agbụrụ na mba ha. Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'akụkụ dị icheiche na mba ahụ kwuru na ha chọrọ ka a mara ihe a ga-eme ndị obi na anụ ọkụ nime ndị na-akpọ isiala Ihe onyonyo BBN ga-abị n'isi njedebe taa. Dịka ihe onyonyo na-eme na Naịjirịa ugbua bụ Big Brother Naịjirịa na-abịa n'isi njedede taa, ọtụtụ na-ajụ kedụ onye ga-eri ngo nde naịra iri anọ na ise ahụ. Ọ bụ Alex, Tobi, Nina, Miracle ka ọ bụ Cee c? N'egwuruegwu Barcelona meriri Sevilla ọkpụ atọ asataghị ihe wee buru iko Copa del Rey nke ugbo anọ n'usoro. Sevilla agbalịla imeri Barcelona ugboro asatọ mana o kweghi ha. Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa: Benue: Ndị ọchịehị egbuola mmadụ 20 Akụkọ kachasị n'abalị: Mmiri ozuzo emebiela ihe na Delta Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa:
[ "Otu Commonwealth", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Benue steeti", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/43854703
Mmọnwụ wakporo ụlọụka Katolịk n'Anambara
Ndị na-eti mmọnwụ wakporo ọgbakọ ndị ụka Katolik n'Uke Anambara steeti merụọ ọtụtụ ahụ ma mebie ụgbọala 30.
2018-04-22T09:46:44Z
Mmọnwụ wakporo ụlọụka Fada 'Ebube mụọnsọ'
Ndị ntorobịa na-agba mmọnwụ Ịgba mmọnwụ bụ emume omenala e jiri mara Ndigbo Ndị mmọnwụ na-eme emume, 'Ụzọ Iyi' n'Uke dị n'ọkpuru ọchịchị Idemili Nọt n'Anambara steeti wakporo ọgbakọ ekpere ndị ụka Katolik ma mebie ihe karịrị ụgbọala iri atọ, merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ, ebe e chere n'otu onye ha mara mma nwuru n'ụbọchị Satọde. Onyeisi nchụaja ọgbakọ ụlọụka ahụ bụ Fada Emmanuel Obimma, nke a ma ama dị ka 'Ebube Mmụọnsọ' na ndị ụkọchụkwụ ndị ọzọ, na ndị ụmụnwaanyị e chiri echichi bịara ebe ahụ gbalahụrụ ndị ntorobịa ahụ wakporo ndị gara ikpere Chineke n'ụka ncheabalị ha mere n'abali Fraide banye n'isi ụtụtụ Satode. Onye nnyemaka ụkọchụkwụ bụ Francis Okoye gwara onye ntaakụkọ BBC n'ekwentị na ndị mmọnwụ wakporo ebe ọgbakọ ụka abalị ahụ n'ihe dịka elekere asatọ nke abalị merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ ma mebie ihe karịrị ụgbọala iri atọ. 'Aguleri na Igboukwu abụghị mbido Ndigbo' Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada "Mgbe ihe mechazịrị, anyị gụkọrọ ụgbọala ha mebirị gụta ịrị atọ. Ha merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ. O nwere ọtụ onye ha sụrụ mma e bugara ụlọ ọgwụ. Anyị amabeghị ma ọdị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ." "O were anya na ndị ntorobịa Uke mere ihe a kwadoro akwado imekpa ndị ụka ahụ n'ihi na, a na-eme 'Uzọ iyi', mmọnwụ na-agbadebe ma ọ kụọ elekere isii nke mgbede mana ndị mmọnwụ a wakpọrọ ebe a na-eme ụka abalị ka ọ kụchara elekere asatọ nke abalị. "Ha bidoro na-eti ndị ji ụgbọala ebute ndị mmadụ bịara ụka ihe, na-anara ha ego ha nakwa ekwentị ha. Mmọnwụ mebiri ọtụtụ ụgbọla n'ọgbakọ ahụ "Ndị ọrụ nche anyị nwara ike ha ịkwụsị ha imebi ihe mana mgbe anyị hụrụ na ihe na-eme akarịala, anyị kpọrọ ndị uweojii oku. Ha bịara nwụchie ụfọdụ n'ime ha." Ndị uweojii Anambra steeti kwuru n'ezie na mmọnwụ wakporo ndịụka n'Uke mana ha kwuru na onweghị onye nwụrụ. Ọnụ na-ekwucitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nkirụ Nwode gwara BBC na "Anyi nwụchịrị mmọnwụ atọ, anyị na-enyocha ihe mere ebe ahụ." Akụkọ kwuru na nke a abụghị mbụ ndị ntorobịa obodo ahụ na-emekpa ndị na-aga ọgbakọ a pụrụiche ndị ụka Katolik na-eme kwa abalị Fraide nke na-adọta ihe karịrị pụkụ iri abụọ kwa izuụka. Ndị nọ ebe ihe meere kwuru na ndị ntorobịa obodo ahụ na-esogbu ndị ọkwọụgbọala na ndịụka na-anapụ ha ego ma na-etikwa ụfọdụ ihe. Na nsonso, ha tiri onye ọrụ Fada Obimma ihe nke mere ụkọchụkwụ ahụ ji kpesara ndịuweojii ndị nwụchịrị ndị ntorobịa ahụ ma ahapụrụ ha oge eze obodo na ndị okenye obodo gboro ọgụ. E boro ebubọ na ndị ntorobịa na- emekpa ndị ọkwọụgbala na-akwọga ndị mmadụ ụka ahụ kwa mgbe Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ụmụaka ruru puku 88 nwere ike ịnwụ n'oke agụụ Benue: Ndị ọchịehị egbuola mmadụ 20 Kedụ otu pati ndị ga-ekpoko iwepụ APC?
[ "Naijiria", "Ụka ndị Roman", "Anambra Steeti", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43856119
'Ndigbo ga-ajụ Buhari ọzọ'
Ezeife na ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okw ekwụola na ịgwa Igbo kwado Buhari ka ha nweta ọkwa na 2023 bụ okwu aghụghọ.
2018-04-22T15:25:49Z
Ezeife: Ndigbo ga-ajụ Buhari ọzọ
Chukwuemeka Ezeife na okenye ndị Igbo ụfọdụ Chukwuemeka Ezeife,onye Igbo-Ukwu bụbu gọvanọ na Anambara Steeti bụ otu onye na-ekwuchitere Ndigbo na Niajiria Ndị nwere agba n'ala Igbo ekwuola na ụmụafọ ịgbo ga-ajụ nkwado onyeisiala Buhari na ntulika nke 2019 dịka ha mere n'afọ 2015. Ha dọrọ Ndigbo aka na ntị ka ha mata na ngwa na ọ bụrụ na ha kwado onyeisiala Buhari ka ọ banye n'ọchịcihị ọzọ n'afọ 2019 na ọkwa onyeisiala ga-erute Igbo aka bụ nkwa a na-ekwe nwaanyị n'elu akwa, nihi na ọ bụ okwu aghụghọ. Na nsọnsọ, otụtụ ndị otu APC gụnyere, Minista na ahụmaka njem bụ Rotimi Amaechi, onye odeakwụkwọ nke gọọmenti etiti bụ Boss Mustafa na kwa onyeisi ndị ụlọọrụ Voice of Nigeria nbụ Ọsita Okechukwu gwara Ndị Igbo ka ha tụnyere Buhari na'afọ 2019, ka oke were rute ha na 2023. Nye Ndigbo onyeisiala 2019 - Balarabe Musa 'A na-emegbu Ndigbo ka ndị emeriri n'agha' Mana ụfọdụ ndị nwere ọnụ n'igbo kwụrụ na okwu ahụ bụ okwụ aghụghọ iji nweta votu Ndigbo, kwụkwọ na ndị dịka Buhari bọrọ ndị Igbo maka entinghirị ya akwụkwọ n'afọ 2015, na ha agahị enyere ya na ntuliaka 2019. Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Sun nwere onye chịbụrụ Gọvanọ n'Anambara Steeti bụ Dr Chukwuemeka Ezeife si: "A hụghị ka ọ ga e si mee. Echeghị na anyị kwesịrị ị na-arịọ ndị mmadụ ọkwa onyeisiala. Uche m bụ na anyị ga-aga rịọ Chineke, Onye mara na ọ bụrụ na onye Igbo were ọkwa dịka onyeisiala, obi ga-adị ndị Fulani mma, dị ndị Yoruba mma, dịkwara ndị mpaghara dị ichiche na Naijiria mma n'ihi na anyị ga-ahazigharị ọnọdụ akụnaụba Naijiria ka ọ ga n'ihu. Ikwu maka 2023 bụ okwu akwụghị ọtọ, onye ọbụla na-ekwu ya bụ iji ghọgbụ Ndịgbo." N'otu aka ahụ, onye bụbu onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Dozie Ikedife, kwuru na Ndigbo bụ ndị ekwerela nkwa inweta ọkwa onyeisiala apụtaghị ihe ọbụịla n'oge gara aga. Ọ gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Sun sị: "E kwela Ndigbo ọtụtụ nkwa dị otu a n'oge gara aga, aghọgbukwara ndị be anyị. Ọ bụrụ na mmadụ ghọgbụo gị ụgboro abụọ ma ọ bụ atọ, ọ bịa nke anọ, i cheba echiche ime. Ike ala a agwụla mmadụ. Ikedife gara n'ihu kwuo sị : "Ihe bụ mkpa m bụ otu a ga-esi gbaso iwu na mkparitaụka nweta Biafra na alụghị ọgụ maọbụ kpalia onye ọbụla." Cheta n'afọ 2015, ọtụtụ Ndigbo atụnyerịghị Buhari akwụkwọ ntuliaka nke mere ka mere o jiri si na ya aghị nye ndị nyere nkwado pasent 95 na ndị nyere ya pasent ise otu ụgwọ, okwu ọtụtụ na-eche o mezuru site ndị o nyere ọkwa ọchịchị kemgbe ọ banyere n'ọchịchị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mmọnwụ wakpọrọ ụlọụka Katolịk n'Anambara Ụmụaka ruru puku 88 nwere ike ịnwụ n'oke agụụ Benue: Ndị ọchịehị egbuola mmadụ 20
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43858572
Nwoke gba ọtọ awakpoola ụlọoriri
Ndị uweoji na-achọ otu nwoke wakporo ndị na-eri nri gbuo mmadụ anọ ebe mmadụ anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ.
2018-04-22T15:58:45Z
Nwoke gba ọtọ awakpoola ụlọoriri na mba Amerịka
Ụlọọriri ebe ihe ahụ mere Ndị uweoji chọtara egbe eji wakpo ụlọọriri a Ndị uweo ji kwuru na otu nwoke gba ọtọ egbuola mmadụ anọ n'ụlọoriri dị n'obodo Nashville na mba Amerịka. Nwoke ahụ tibara n'ime ụlọoriri ahụ ebe elekere asatọ nke ụtụtụ n'Antioch ma malite ị gba ndị mmadụ egbe. Mmadụ anọ ndị ọzọ merụkwara ahụ tupu onye ọzọ na-eri nri ebe ahụ anapụ ya egbe oji, o we gbapụ ọsọ. Ndị uweoji enyela aha nwoke ahụ ka Travis Reinking dị afọ iri abụọ n'itoolu bụ onye si obodo Illinois ebe ha jisiike na-achọ ya. Akụkọ ga-amasị gị Mmọnwụ wakpọrọ ụlọụka Katolịk n'Anambara Ụmụaka ruru puku 88 nwere ike ịnwụ n'oke agụụ Benue: Ndị ọchịehị egbuola mmadụ 20
[ "Amerika", "National security" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43861972
Soyinka: Ọchịchị adaala na Naijiria
Onye nwere nzere Nobel bụ Wole Soyinka ekwuola na ezi ọchịchị akpụọla afọ n'ala na Naijiria.
2018-04-23T05:44:28Z
Soyinka: Saanụ anya mmiri na 2019
Wole Soyinka Wole Soyinka adọrọ ndị Naijiria aka na ntị ka ha Wole Soyinka bụkwa odee akwụkwọ a mara amara adọọla ndị Naịjirịa aka na ntị ka ha saa anya mmiri ghara ikwe ka ndị ndọọndọrọ ọchịchị ghọgbu ha ọzọ na ntuliaka na-abịa n'afọ 2019. Soyinka, onye nke kwuru nke a ụbọchịụka n'emụme ncheta ọmụmụ onye ọkaiwu a mara amara nwụrụ anwụ bụ Gani Fawehinmi nke e mere na Legọs kwuru na obodo Naijiria na ọchịchị onyekwuoucheya nọ na nsogbu ugbua. Ọ si na ndị tinyere Naịjirịa na nsogbu ọ nọ na ya ugbua site na atụmatụ ha, e jikerela onwe ha ọzọ dịka ndị nzọpụta ka ntuliaka na-abịa., ma dụọ ndị Naijiria ọdụ ka ha jụ ndị ndọrọndọrọ ochie iji nye ohere ka ndị agba ọhụrụ were ọchịchị. Buhari na ndị isi otu APC enwela mkparịta ụka Wole Soyinka: Chikọtanụ onwe ụnụ ọnụ ka okenye zuo ike Ọ sịrị: "A naghị enyo ya enyo na ọchịchị onyekwuoucheya nọ na nsogbu. Ọ bụghị sọsọ ọchịchị onyekwuoucheya, obodo anyi nọ na nsogbu. Echeghị m na o nwere oge na ndụ niile n'ụwa , ọkachasị n'ala a oge nchere ihe niile dakpọrọ adakọ otu a. Anyị niile maa nke a. "Ajụjụ bụ anyị ana-ahụ ya dịka ohere nzọpụta ka anyị a na ahụ ya ha ohere ị ga n'ihu na-eme ihe ndị ahụ mere na ala anyị na akpụ afọ n'ala? ọ bụghị akụkọ ọhụrụ mkpa ọ dị imee ihe ga-azọ ịdịkọnotu ala Naijiria. "Ọ bụ ihe mgbagwojuanya na ndị bụ ndị iro ọchịchị onyekwuoucheya ndị ji aka ha webata atụmatụ nke butere anyị n'ọnọdụ anyị nọ taa bụ ndị pụtara na egosi onwe ha dịka ndị nzọpụta nke ala Naijiria na-ele anya, obodo nweere ọnụọgụgụ mmadụ nde 200." Soyinka gara n'ihu dụọ ndị Naijiria ọdụ ka ha saa anya mmiri iji gbalahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mmọnwụ wakpọrọ ụlọụka Katolịk n'Anambara Ụmụaka ruru puku 88 nwere ike ịnwụ n'oke agụụ Benue: Ndị ọchịehị egbuola mmadụ 20 "Ọ gbara m gharịị na ka a na-ekwu okwu ịzọpụta ala Naijiria, otu otu maọbụ abụọ pụtara ndị nwere ndị nọ n'isi ya na eso. A na ma agwa ndị mmadụ ka ha na-enyo ha enyo n'ihi ndị na awanye onwe ha na otu ndịa bụ ndị soro dowe Naijiria na ọnọdụ ọchịchị onyekwuoucheya nọ taa."
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43865296
Ndị Naịjirịa agaghị nzụkọ n'Amerịka?
Gọọmentị Naịjirịa agọrọla ọnu ha maka ihe mere na nzụkọ ndị chọrọ itinye ego na Naịjirịa na ndị minista nwere n'Amerịka.
2018-04-23T12:33:35Z
Kedu ihe mere ndị Naịjirịa agaghị nzụkọ mgbere n'Amerịka?
Yemi Osibanjo na Abuja Yemi Osibanjo so na ndị aha dị n'akwụkwọ eji hazie ha bụ nzụkọ Ọtụtụ ndị na-anọchịte anya gọọmentị Naịjirịa atụrụanya na ha nọ n'ọgbakọ ụlọọrụ na-ahụ maka Naịjirịa na mba Amerịka haziri n'obodo Washington DC egosịghị ihu na ya bu emume. Ọbịbịa ndị gọọmentị ahụ abịaghị mere ka ndị mmadụ na-enwe ịtụnanya na Naịjirịa agaghị enweta ntunye ego site na mba ofesi. Ndị kwesiri ịga ebe ahu gunyere osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo, mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Kemi Adeosun, mịnịsta nke mmanụ agbịdị bụ Ibe Kwachukwu, mịnịsta nke ọrụugbo bu Audu Ogbeh, mịnịsta nke tecknụzụ bụ Ogbonnaya Onu, mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed, mịnịsta nke okwute ndị bara uru bụ Kayode Fayemi na mịnịsta nke mgbere bụ Okechukwu Enelamah. Ụtụ anwụrụ na mmanya etinyela ego Switzerland ekwetala iweghachite ego Abacha buuru Otu onye ihe a ndị gọọmentị mere na-ewute bụ Eze ndị Kano Sanusi Lamido, bụ onye rụbụrụ ọrụ ka onye nhazi ụlọakụ ukwu na Naịjirịa. Ihe Sanusi kwuru Sanụsi kwuru na onye na-akwado itinye ego n'Afịrịka, "o nwere Naijirịa, onwere Gana, o nwere Rụwanda, Kenya na Sawụt Afịrịka". Ọ gakwara n'ihu kwuo, "Naịjirịa nwere ike karịa ndi ọzọ niile n'ịtụ mgbere, mana o nwere ike sị kama ya ga etinye dọla 500 na Naịjirịa, ka m tinye dọla 100 na Ghana, dọla 100 na Rụwanda, dọla 100 na Code Vuwa, ka o nweta nrite mgbasa aka." "Anyị gara ka anyị na ndị nwere ego ha na-etinye na mba mee nzụkọ, anyị kwesiri ibido na elekere itoolu, anyị wee bido na elekere iri. Mgbe m ruru ebe ahụ, ha kpọrọ m ga n'ụlọọrọ onye na-anọchịte anya Naịjirịa. Ndị bịara nzụkọ ahụ nọ ebe ahụ, osote onyeisiala anọghị, ndị mịnịsta anọghị," Sanusi kwuru. Sanusi sị na ihe a mere adịghị mma, maka na ọ na-egosi na Naịjirịa adịbeghi nkwadobe maka ihe a na-ekwu okwu ya. O kwuru, "Unu kpọrọ ndị mmadụ ka ha bịa nụrụ etu e si atụ mgbere na Naịjirịa, mana unu abịaghị. Ọbụghi etu a ka esi enwete ndị ga-etinye ego na Naịjirịa. Ya bụrụ na ọ bụ ndị Rụwanda haziri ọgbakọ a, onyeisiala ha bu Kagame ga-anọ ebe ahụ na-agwa ndi mmadụ bịawa Rụwanda. Ndị mmadụ tinyekwere ọnụ n'okwu a na soshal midia. Onye nwere akara @SegunAndrews kwenyere n'ihe Sanusi kwuru. Mana, gọọmentị ekwuola na ọbụghị etu a ka ha bụ ihe siri ga. Laị Mohammed bụ mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi zipuru ozi na-akọwa na ọ bụghị eziokwu na ndị kwesịrị ịga ya bụ nzụkọ agaghị. Mohammed na-akọwa na ndị mịnịsta aha ha dị n'emume a enwetaghị akwụkwọ e ji si ha bịa ya, maọbụ nọdụ na Washịntịn DC mgbe ọgbakọ a na-eme. O kwuru na mịnịsta ọrụugbo, nke ọkụ latrik na ọrụ na nke okike ego na-ahazi enwetaghi akwụkwọ agbanyeghị na aha ha dị n'akwụkwọ ndị ga-ekwu okwu na ya bụ ọgbako. Mịnịsta nke mgbere na onwe ya so onyeisiala gawa nzụkọ ndị na-achị mba ndị so na Commonwealth bi na London. Mịnịsta na-ahu maka ego nọ na Washịntịn DC, mana ọ bụ maka nzụkọ ndị ụlọakụ ụwa na IMF. Ọ gakwara n'ihu kwuo na mịnịsta na-ahu maka mgbasa ozi na omenala nwetere akwukwọ, mana ọ zara ya were gwa ndị na-ahazi ọgbako a na ya agaghị aganwu maka ihe ndị ọzọ aka ya di na ya. Lai Mohammed kwuru na "Ihe ndị a gosiri na e kwesịghị ikwu na ndị Minista ekweghi ịga ya bu nzụkọ.
[ "Naijiria", "Amerika", "Akụ na ụba", "Ahịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43862347
Ọsọ okara-ikpeazu Champions League esula
Ahaziela usoro aga eji sọọ mpị ọkara-ikpeazu Champions League nke afọ a ka Roma ga ezute Liverpool echi.
2018-04-23T13:58:20Z
Liverpool, Roma, Real Madrid na Bayern Munich na-akwado asọmpi
Liverpool na Roma Liverpool na Asọmpị enyi na enyi Liverpool na Roma n'afọ 2016 Ọsọ ihu ọnọdụ ikpeazu n'asọmpi UEFA Champions League ebidola. N'asọmpi ọkara-ịkpeazụ na-abịa, Bayern Munich na Real Madrid, Liverpool na Roma na-akwado ịsọ mpị egwuregwu nke mbụ ga-eme ka amara onye ga-emeri ma gafee n'asọmpi ikpeazụ. Liverpool na Roma ga-asọ mpi ha echi bụ ụbochị 24, Bayern Munich na Real Madrid ga-asọmpi n'ụbọchị 25 n'ime ọnwa a. Man United meriri Tottenham n'asọmpi FA N'ikpeazụ, Arsene Wenger ga-apụ! Kenneth Umerie bụ onye ọkachamara n'egwuregwu bọọlụ gwara BBC Igbo na asọmpị a ga-ekpo ọkwụ. Mana o kwuru na Liverpool nwere ike imeri Roma n'asọmpi a makana oteela otu ọbụla meriri Liverpool n'ụlọ ha. O kwuru na Mohamed Salah, Sadio Mané na Roberto Firmino ka na-eme nke ọma n'otu Liverpool. Jupp Heynckes na Zinedine Zidane N'asọmpị Bayern Munich na Real Madrid. Umerie kwuru na Bayern Munich na Real Madrid na-eme ihe siriike. Ihe pụtara na ọ ga-dị ọrụ ị ma ka asọmpị a ga-aga. Ugbua, Bayern Munich emeriela Bundusliga nke afọ a, nke a akpaliteela mmụọ ha, ma nye ha olileanya na ha ga-eru ikpeazu n'asọmpị Champions League. Asọmpi nke ikpeazu Champions League ga-eme n'ụbọchị 26 n'ime onwa Mee. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị uweojii atọhapụla Dino Melaye Nwaafọ Igbo emeriela Big Brother Naija Ndị Naịjirịa agaghị nzụkọ n'Amerịka?
[ "Egwuruegwu", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43865297
Ndigbo kwesiri ime ihe ka asụsụ anyị ghara ịnwụ -Ikeogu
Ikeogu Oke ritere puku dọla 100 dịka onye ọkachasị ede mbem na Naịjira n'afọ 2017.
2018-04-23T14:18:52Z
'Ekwela ka Igbo nwụọ'
Onye ritere ihe nrite dịka onye bụ ọkachasị n'ide akwụkwọ na Naịjirịa n'afọ 2017 bụ Ikeogu Oke ekwuola na asụsụ Igbo agaghị anwụ ma ndị Igbo kpọọ ya mkpa. Ikeogu ritere ego puku dọla 100 dịka onye kachasị ede mbem na Naịjirịa nke a kpọrọ "Nigerian Prize of Literature" maka akwụkwọ ya ọ kpọrọ “The Heresiad”. Ihe mere akwụkwọ ahụ ọdị iche bụ na o dere ya n'usoro ndị Igbo ji agụ mbem. Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere, Maazị Oke kwuru okwu gbasara nchekwa asụsụ Igbo, na onye o chere na o kwesịri ịdị n'aka ya.
[ "Agụmagụ", "Naijiria", "Omenala" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43872177
Ebe ego Abacha ga-aba
Kemi Adeosun bụ minista na-elekọta ihe gbasara ego ekwuola ihe gọọmentị etiti ga-eji ego Abacha mee na Naịjirịa.
2018-04-23T19:47:09Z
Gọọmentị etiti ekwuola ihe a ga-eji ego Abacha zuru mee
Kemi Adeosun na Christine Lagarde bụ onyeisi oche na IMF Kemi Adeosun na Christine Lagarde bụ onyeisi oche na IMF Gọọmentị Naijiria akwadola iji ihe kariri dọlla nde dọlla narị atọ bụ ego Abacha zuru nke gọọmentị Swiss weghachitere ga-eme. Minista na-ahụ maka ihe gbasara ego bụ Kemi Adeosun ekwuola na a ga-eji ego ahụ zụọ ndị ụbiam dịka Onyeisiala Buhari kwere na nkwa mgbe ọ na-azọ ọchịchị. O kwuru nke a ebe ọ na-ezi ndị ntaakụkọ ozi na ngwucha nzụkọ ngalaba na-eke ego n'ụwa niile bụ IMF na-aha ịchafụ nke mere n'obodo Washington na Amerịka. Adeosun sị kwa na-etinyela ego a n'akpa pụrụiche n'ụlọakụ Niajiria a kpọrọ CBN n'aha ịchafụ iji bido mepụta atụmatụ ndị ga-enyere ndị ogbenye aka. Ụtụ anwụrụ na mmanya etinyela ego Ndị sinetị akpọọla onyeisi ụlọakụ ukwu Na ozi ọ na-agbasa, ọ sị na gọọmentị etiti nwere olileanya na ha mepụta atụmatụ ha bu n'obi, n'ihe ga na-adịri Naịjiria mma. N'olu ya "Anyị tinye atụmatụ ndị a na mmepụta, akụ na ụba obodo Naịjiria ga-arị elu" Kedu ihe Naịjirịa na-erite na CHOGM? Nwaafọ Igbo emeriela Big Brother Naija Ndị Naịjirịa agaghị nzụkọ n'Amerịka?
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Naijiria", "International Monetary Fund (IMF)", "Akụ na ụba" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43861978
Ihe atọ inwe ọtụtụ ọnụ mgbanwe ego na-ebute
IMF gwara Naijiria ka ọ chịkọta ọnụ mgbanwe ego ya ka ọ bụrụ otu, ebe ndị ọkacharamara na-ekwu ọghọm dị na inwe ọtụtụ.
2018-04-24T04:12:13Z
Ihe atọ inwe ọtụtụ ọnụ mgbanwe ego na-ebute
Naira EFCC kwuru na Umar chọ nde naira ịrị Iji mee ka mgbanwe ọnụ ego Naijiria kwụdosie ike, IMF adụọla Naijiria ọdụ ka o jikọta mgbanwe ego ya ọnụ. Naijiria nwere opeka mpe mgbanwe ego ise ; otu maka ndị na-atụbata mmanụ ụgbọala na Najiria, otu maka ndị ụkaalabụkụba na-aga njem okwukwe na Saudi Arabia, otu maka ndị ụka Kraist na-aga ala nsọ, ọzọ maka ndị na-agụ akwụkwọ na mba ofesi na otu ọnụ nke gọọmenti hiwere. Dịka ndị ọkacharamara n'okwu akụnaụba bụ Pat Utomi na Uche Uwaleke siri kọwara onyentakụkọ BBC, inwe ọtụtụ mgbanwe ego nwere ọghọm. Lee ụfọdụ ọghọm inwe ọtụtụ mgbanwe ego: 1. Ọ na-ebute mmerụaka Pat Utomi kọwara na ọ na-eme " Onye maa mmadụ enwe ohere igote ego n'ọnụala ma were ya tụọ mgbere, mana onye nwere mkpa ego ahụ iji tubata ihe ọ ga-eji mepụta ngwa ahịa n'ala anyị na amaghị mmadụ ọ gaghị eru ya aka. Ọdịghị mma maka ọganihu azụmahịa." Ebe ego Abacha ga-aba Mgbanwe ego: Dọla ọdaala n'akụkụ Naịra? N'okwu ya, Uwaleke nyere ọmụmatụ sị, "Dịka ọnụ ego mgbanwe nke gọọmenti bụ N305 , e resi mmadụ n'ọnụ ahụ, o nwere ike hapụ ihe a sịrị ya gote, resi ya onye ọzọ N365, nweta ọmụrụnwa.Mana ọ bụrụ na e nwere otu mgbanwe ego, ị gaghị enwe ike iregharị ya." 2. Ọ na-emenyụ ọkụ itinye uchu na imepụta ihe n' obodo. Uwaleke sịrị na inwe mgbanwe ego dị ọtụtụ na-eme ọtụtụ ha dị uwengwụ. 'Sọọsọ ihe ha ga na-eme bụ ire ego dị ọnụala, agahị na-enwe mmepụta ihe.' 3. Ọ na eweda mmụbanye akụnaụba obodo Utomi kwuru na "ọ bụrụ na ndị mmadụ na-enweta ego mgbanwe ego n'ọnụ ala iji ziga nwa ha obodo oyibo maka ịgụ akwụkwọ, ọ ga-eme ka onye ọbụla chọọ iziga nwa ya obodo oyibo, ụlọ akwụkwọ ndị dị n'obodo anyị ga akpụ afọ n'ala. Mana ha go ya n'ọnụ otu mgbanwe ego, ọ ga-eme ka ọtụtụ ego a na-etinye n'aguakwụkwọ na Naijiria jenite." N'afọ ole na ole gara aga, Naijiria nwere nsogbu mgbanwe ego dịka akụnaụba ya kpụrụ afọ n'ala n'ihi ọdịda ọnụ ahịa mmanụ agbidi n'ahịa mba ụwa. Ọ bụ ọnọdụ a mere na, dịka Uwaleke siri kwuo, ọ gaghị adabara Naijiria iso ndụmmọdụ IMF nyere. Uwaleke kwuru na ọ bụrụ na Naijiria nwe ya ugbua, na ọ ga arịa ya ahụ ịkwụ ụgwọ o ji na mba ofesi n'ihi n'ọ ga a dịrị ya oke ọnụ. Akụkọ ga-amasị gị: Kedu ihe Naịjirịa na-erite na CHOGM? Ndị Naịjirịa agaghị nzụkọ n'Amerịka? Ndị uweojii egbochiela ụlọ Dino Melaye
[]
https://www.bbc.com/igbo/43882575
'Etu m si nweta ọgwụgwọ ọrịa kansa'
Gloria Orji bụ nwaada Igbo meriri kansa ma dị mma, o na-ekwu na ebe o meriri kansa, onyeọzọ ga-emeri kansa.
2018-04-25T08:48:36Z
World Cancer Day: Etu m si nweta ọgwụgwọ ọrịa kansa - Onye meriri Kansa ara
Ọrịa kansa bụ ọrịa na-eyi ụwa niile egwu maka etu o si egbu ndị mmadụ. Nke ka njọ bụ ndị na-achọ ọgwụgwọ na-achọ ya mana onwebeghi ọgwụ ewepụtara na ya bụ ọgwụgwọ ya. Isiokwu emume ncheta ọrịa Kansa nke afọ 2019 bụ "Enwere m ike , ị nwere ike" nke pụtara na anyị niile nwereike ịwakpo ọrịa Kansa. Mana nwaada Gloria bụ onye chọpụtara akpụ kansa n'ara ya n'afọ 2010, a waa ya ahụ, o mee kimo na ihe ndị ọzọ niile wee merie ya bụ ọrịa. N'okwu ya , "Kansa abụghị ikpe ọnwụ", ugbua, ọ na-etinye ọnụ na okwu gbasara ụmụnwaanyị kansa na-arịa. Ọ gwara BBC Igbo etu o siri merịe ya bụ ọrịa na-atụ ụwa niile egwu.
[ "Naijiria", "Ahụike", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43899224
Akụkọ kachasị n'abalị a: Ndị omeiwu nta akpọọla Buhari
Ndị omeiwu nta akpoola Buhari ka ọ za ajụjụ maka ọtụtụ ogbugbu mmadụ na-eme na Naịjirịa.
2018-04-25T17:08:09Z
Akụkọ kachasị n'abalị a: Ndị omeiwu nta akpọọla Buhari
Akụkọ kachasị n'abalị a Ndị omeiwu nta akpoola Buhari Ndị omeiwu nta akpọọla onyeisi ala Naịjirịa ka ọ za ajụjụ maka ọtụtụ ogbugbu mmadụ na-eme na Naịjirịa Ha kwukwara na oge eruola mgbe Buhari ga-akpọ ndị ọchịehị a na-egbu mmadụ ndị agha oyi egwu. Nghaghari iwe otu Krist Otu ụka Krist akpọrọ Christian Association of Nigeria na bekee ekwuola na ha ga-eme nghagharị iwe na ekpere maka ntọghapụ Leah Sharibu na ndị umụakwụkwọ Chibok ndị Boko Haram jiri n'ubọchị uka na-abia. Ha kwuru na ha na-eme ihe a maka ndị ụkọchụkwụ katolik abụọ ndị ochịehi bu egbe gburu na Benue steeti ụnyahụ. Otu Red Kross n'ala Kenya ekuola na nnukwu ide mmiri di n'etiti ala ahụ achụọla mmadụ ruru puku narị abụọ na bee ha. Ha kwukwara na oke mmiri na-ezo n'ala ahụ nwere ike ịchupu puku mmadụ ndi ọzọ ma tochịe ụzọ. Ha ka na-azọpụta ndị mmadụ na mpaghara ebe ahu ugbua. Asọmpị Bayern Munich na Real Madrid Bayern Munich na Real Madrid ga-asọ mpi n'abalị a n'asọmpị iko Champion League. Nke a bụ ukwu nke mbụ. Chete na Liverpool meri Roma ọkpụ ise mana ha asatara abụọ. Gere akụkọ mere n'abalị a n'otu nkeji: Lee ihe nkiri anyị Gụọ akụkọ ndị ọzọ Ihe anọ ịmaghị maka ọrịa ịba Real Madrid na Bayern ga-achịpụ ya taa
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Benue steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43901680
INEC ebidola ụsoro iwepu Dino Melaye
Ọ dị ka sineto Naịjirịa nke na-agba ndị uweoji mgba abanyela ọnwụnwa ọzọ ebe INEC na-akwado iwepu ya.
2018-04-25T20:13:14Z
Ọnwụnwa ọzọ abịarala Dino?
Ndị na-edenye aha na INEC INEC na enyocha ndị denyere aha ntụliaka n'obodo Kogi West dịka iwu si kwuo Ngalaba na-ahụ maka ntụliaka na Naijiria bụ INEC n'aha ịchafụ ebidola usoro iji wepu Sineto Dino Melaye n'oche ọchịchị n'obodo ya bụ Kogi. Onye na-anọchite anya INEC na Kogi steeti bụ Ọkachamara James Apam kwuputara nke a taa ebe ha bidoro ị nyocha ndị denyere aha ntụliaka n'obodo ya. Cheta na ụlọikpe enyebula INEC ikike ị ga niru were bido nwepu a a ga-eme Melaye ga-ebido n'ezie n'ụbochi satọday na-abịa. Ndị uweojii akpọgala Dino Melaye Lokoja Gịnị mere ndị uweojii 200 jiri wakpoo Dino Melaye? Melaye chọrọ ịgba onyeisi uweojii akwụkwọ Dino Melaye bụ sinetọ ndị uweojii na-agba mgbo ị nwuchi ka ọ zaa ajụjụ maka okwu ụgha ọ gwara ndị uweojii na ndị omekome wakporo ụgbọala ya. Ndị ụlọọrụ sineti sọnyere osote onyeisioche ha bụ Bala Na'Allah ị ga leta Dino Melaye ebe ọ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ. Akụkọ kwuru na ọ merụrụ ahụ ebe ọ na-achọ ị gbapụ ọsọ nwere onwe ya n'aka ndị uweojii mgbe ha kpụ ya a ga ụlọ mkpọrọ. Melaye ebe ebu ya aga ụlọọgwụ Minista ochie Naịjirịa bụ Femi Fani-Kayode akatọla emume Melaye na-eme n'elu igwe okwu soshal midia: Akụkọ ga-amasị gị: Akụkọ kachasị n'abalị a: Ndị omeiwu nta akpọọla Buhari Ihe ndị ị kwesịrị ịma tupu ị lụọ nwaanyị Igbo Chimamanda na okwu feminizim
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Nchekwa ndị ụwe ojii" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43912784
Akụkọ kachasị n'abalị a: Gọọmentị akwụọla ezinaụlọ Apo 8 ụgwụọ iti aka n'obi
Gọọmentị akwụọla ezinaụlọ Apo 8 ụgwọ iti aka n'obi na akụkọ sị Abia na egwuregwu.
2018-04-26T18:02:31Z
Gọọmentị akwụọla ezinaụlọ Apo 8 ụgwụọ iti aka n'obi
Akụkọ kachasị n'abalị a Gọọmentị akwụọla ezinaụlọ Apo 8 ụgwọ iti aka n'obi Gọọmentị etiti akwụọla ụgwọ ruru nde naira otu narị iri atọ na ise dịka ụgwọ ịti aka n'obi Ọ bụ ezinụlọ mmadụ asatọ ahụ egburu na Apo n'ime obodo Abuja n'afọ 2013 ka ha kwụrụ ụgwọ a. Omeiwu ukwu akpọọla onyeisiala Mohammadụ Buhari Ndị omeiwu ukwu akpọọla onyeisiala bụ Mohammadụ Buhari ka ọ za ajụjụ maka ọtụtụ mmadụ ha na-ekwu na ndi ochịehi gburu na Benue steeti. Chete na ụnyahụ ndị ome iwu nta kpọrọ onyeisi ala maka ị za ajụjụ gbasara ogbugbu mmadụ na steetị a. Mana Buhari ekwubeghị oge ọ ga-abịa za ajụjụ a. Mmadụ marị iri anọ apụọla na APGA na APC N'Abia steeti, mmadụ ruru otu narị na iri anọ esiila partyi APGA na APC gawa PDP. Ha kwuru na ha pụrụ makana mpu na aghughọ akariala n'otu ndọrọndọrọ ochịchị ahụ. Anthony Joshuanaghị anabata aka mgba Deontay Wilder ugbua Anthony Joshua ekwuola na ya anaghị anabata aka mgba Deontay Wilder maọbụrụ na ya hụbeghị ego ahụ ruru nde dolla iri ise. Cheta na Deontay Wilder wepụtara ego a iji maa Joshua aka ọkpọ. Na bọọlụ Arsenal na Atletico Madrid ga-asọ mpi n'iko Europa League Marseille na FC Red Bull ga-asọ kwa mpi n'iko asọmpị iko a Gere akụkọ mere n'abalị a n'otu nkeji: Akụkọ ndị mere taa.. Lee nri di iche iche esi n'akpụ emepụta Akụ na ụba Lionel Messi ga amụbanye MASSOB - Ebere Buhari na-eme enweghị isi
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Abuja" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43912786
Ị bụ onye mwakpo ụmụwaanyị - Ụlọịkpe
Bill Cosby nwere ike ị ga mkpọrọ ruru iri atọ maka mwakpo nwaanyị n'ike.
2018-04-26T18:49:58Z
Ikpe amaala Bill Cosby n'ebubo mwakpo nwaanyị
Bill Cosby Bill Cosby bụ onye ama ama dika onye ọkpaọchị Ụlọikpe n'Amerika ekpebiela na ikpe mara onye ọkpaọchị bụ Bill Cosby n'ebubo atọ eboro ya dika onye na-awakpo ụmụnwanyị n'ike. Ọ bụ Andrea Constand bụbu onye egwuregwu basketbọọlụ na-ekpe Cosby n'ụlọikpe ka mgbe afọ 2004. Kpọpụta Nnamdi Kanu ụbọchị ikpe ya Ụlọikpe enyela iwu ka anwụchie Innoson Cosby dị afọ 80, ka na-agọ ebubo a, mana mkpebia nwere ike ị tinye ya na mkpọrọ ruo afọ iri atọ. Nke a bụ ugboro abụọ Cosby na-azọ isi ya n'ulọikpe maka ebụbọ mwakpo ụmụnwaanyị. Bill Cosby bụ onye ama ama na ihe onyonyo akpọrọ 'The Cosby Show' na bekee. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ka na-ebo Cosby ebubo mwakpo n'ike mana Cosby kwuru na ha niile bụ asị. Akụkọ ga-amasị gị: MASSOB - Ebere Buhari na-eme enweghị isi Lee nri di iche iche esi n'akpụ emepụta
[ "Amerika", "Ikpe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43959090
Codeine, ọtọmegbum
'Codeine, ọtọmegbum' bụ akụkọ etu oke ịṅụ ọgwụ ụkwara sị na-ala ndụ ndị na-eto eto na Naijiria n'iyi nke BBC nyochapụtara.
2018-05-01T05:53:03Z
Codeine, ọtọmegbum
'Codeine, ọtọmegbum' bụ akụkọ etu oke ịṅụ ọgwụ ụkwara sị na-ala ndụ ndị na-eto eto na Naijiria n'iyi. Ndị ntaakụkọ BBC mere nyocha nzuzo were gbaa n'anwụ etu ndị na-emepụta ọgwụ, ndị na-ere ya siri na-eresị ụmụaka ọgwụ n'ụzọ megidere iwu ala Naijiria.
[ "Ịṅụ ọgwụ", "Naijiria", "Ahịa ọgwụ", "Ọgwụ", "Ịṅọgwụ ike", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43959658
Ụka Metọdist: Kpọọ ndị ọchịehi 'ndị oyiegwu'
Ndị isi ụlọụka Methodist na Naịjirịa agwala onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọkpọ ndị ọchịehi ndị oyiegwu.
2018-05-01T11:50:48Z
Ụka Metọdist: Kpọọ ndị ọchịehi 'ndị oyiegwu'
Buhari Onyeisiala Naịjirịa bụ onye ikpeazụ ga-ebinye aka n'akwụkwọ maka ịhazigharị ụsoro ntụliaka ndọrọndọrọ ọchịchị ụgbụa Ụka Metọdist na Naịjirịa akpọkuola onyeisiala Muhammadu Buhari ka o kwupụta ndị ọchịehi dịka otu na-eyi ndụ egwu n'ihi ogbugbu ndị mmadụ ha na-egbu na Naịjirịa. N'ime ozi onyeisi( Prelate) ụlọụka ahụ bụ Eminensị Samuel Kanu Uche na odeeakwụkwọ ọgbakọ ha bụ Rev. Michael Akinwale wepụtara na ngwụcha ọgbakọ ndị isi ụlọụka ha mere na Yaba, Legọs Steeti. Samuel Kanu kwuru na echiche na agwa ndị ọchịehi mere ka ha dịka ndị Boko Haram bụ ndị a kpọrọ otu na-eyi ndụ egwu kemgbe 2013. Onyeisi ụka ahụ katọrọ ọchịchị Buhari maka ịkpọ otu Ipob ndị na-eyi egwu ma gbaa nkịtị n'okwu gbasara ndị ọchịehi. 'Buhari gbara nkiti ihe na-emebi' 'Wepụ aha IPOB dịka 'otu oyiegwu' Ọ katọkwara ogbugbu ndị ụka kraịst na ndị ụkọchukwu ụka Katọlik abụọ na Benue Steeti ma kpọkuo ọchịchị Buhari ka o cheekwa ndụ ndị Naịjirịa agbanyeghị okpukperechi ha. O kelere gọọmentị na mkpebi ha igbochi ịchịgharị ehi ma hiwe ọdọ ebe a na-azụ ehi iji kwụsị ogbugbu ndị mmadụ. " E kwesiri ime ihe niile iji kwado ịdịnotu n'etiti ndị Naịjiria agbanyeghị okpukpere chi ọbụla. O kwukwara na ndị ọrụ nchekwa ala Naịjirịa anaghị arụkọ ọrụ ọnụ bụ nke mere e ji tọọrọ ụmụakwụkwọ Dapchi na Yobe Steeti. Akụkọ ga-amasị gị: Codeine,ọtọmegbum Lee ihe ndị Buhari na Trump kpara taa Ụzọ anọ Buhari jiri yie Trump
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43962478
Codeine ọtọmegbum: Emzor achụọla ndịọrụ
Emzor Pharmaceuticals achụọla otu onye ọrụ ha maka akụkọ nchọpụta, Codeine Ọtọmegbu' nke BBC mere.
2018-05-01T13:05:08Z
Codeine ọtọmegbum: Emzor achụọla ndịọrụ
Nwata nwoke na aṅụ ọgwụ ọgwụ ụkwara,copdeine Akụkọ na-ekwu na ụfọdị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eke ndị ntorobịa ọgwụ dịka ihe onyinye Ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ na Naịjirịa bụ, Emzor Pharmaceuticals,achụọla otu onyeọrụ , ma kwụsịkwa abụọ ọrụ n'ike n'ihi aka ha tinyere n'ire ọkwụ ụkwara codeine, n'ụzọ megidere iwu, dịka akụkọ nchọpụta nke BBC mere nke gosiri ka ọgwụ ụkwara ahụ sị ala ndụ ndị ntorobịa Naịjirịa n'iyi. Emzor chụrụ onye otu onye ọree ahịa ha nke resiri onye ntaakụkọ BBC ọgwụ, Emzolyn syrup. Ha kwuru nke a na igwe okwu soshal midia ka BBC wepụtachara ihe onyonyo ha mere n' ụbọchị Monde abali 30 nke ọnwa Epreelu. N'ime ihe onyonyo ahụ zuru otu elekere, e gosịrị otu ndị ahịa ọgwụ ndị gụnyere otu onye ọrụ Emzor ji ụzọ azụlọ na-eresi ndị mmadụ ọgwụ ụkwara. Iwe na ọnụma juru ndị bịara nkiri ihe onyonyo ahụ nke egosiri na Legos ụnyaahụ Otu onye kwuru na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-etinye mmanụ n'ọkụ a na-agba na Kano dịka o kwuru na ha na-eke ndị ntoroọbịa ọgwụ a dịka ihe onyinye. Mana ụlọọrụ Emzor agọọla na ha anaghị ere ọgwụ n'ụzọ n'ezighi ezi. Ha kwukwara na ha akwụsịla ire Emzolyn nwere Codeine rue mgbe ha ga-emecha nyocha n'ime ebubo na ha na-ere ọgwụ ụkwara ha n'ụzọ akwụghị ọtọ. Emzor kwụsịburu one oreeahịa ha ma meecha chụọ ya n'ọrụ. "Emzor Pharmaceuticals bụ ụlọọrụ na-akwanyere onwe ya ugwu ma na akwụwa aka ya ọtọ. nke nwere akwụkwọ ikike ire ọgwụ karịrị otu narị na iri abụọ nke gụnyere Emzolyn Codeine n'aka NAFDAC. " Ha gara n'ihu sị: A kwụsịla nkesa Emzolyn Codeine yue mgbe a ga-emecha nyocha zuru oke.'' Na mkparịtaụka BBC na onyeisi ngalaba n'ahụ maka nhazi ọzụzụ na ọrụ ndị omeeọgwụ (pharmacists) na Naịjirịa na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ J.C Okafor nwere. O kwuru sị na e nwere iwu na-echekwa ka esi ekesa ọgwụ ụkwara nwere codeine, ma kwụwa n'ụlọọrụ ọbụla achọpụtara na ha na-ekesa ya n'ụzọ ezighị ezi, a ga-emechi ya. Okafor sị,"Anyị nwere atụmatụ etu e ji ekesa ọgwụ ụkwara nwere codeine na Naijiria nke meere na mmadụ enweghị ike ịzụ ya na-ejighị akwụ onye dọkịta. Ụlọọrụ ọbụla a chọpụtara dara iwu ahụ, anyị na-emechi ya." Otụtụ ndị Najiria nọ na choal midịa na-ata Emzor ụta maka aka ha ndị na nsogbu oke ịṅụ ọgwụ ụkwara dị n'etiti ndị na-eto eto. Otu onye jụrụ ụlọọrụ ahụ sị : Ya mere, ọ bụrụ na ụlọọrụ BBC egosighị nchopụta ahụ, ụlọọrụ unu agaghị eme ihe ọ bụla iji kwụsị oke ịṅụ ọgwụ a n'etiti ndị ntoroọbịa? Ọ bụ na ndị ọrụ ụnụ amaghị ihe ha na-eme? Onye ọzọ, Mairo Mandara, kpọrọ oku ka gọọmenti machie orire ọgwụ ụkwara nwere codeine.
[ "Naijiria", "Ahụike", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43986554
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Obasanjo akpọpụtala Buhari
Obasanjo akpọpụtala Buhari ọzọ,UN adọọla aka na ntị ka onyeisiala mba Amerịka nakwa otu egwu bọọlụ Liverpool abaala agba ikpeazụ nke asọmpi Champions Lig
2018-05-03T06:56:11Z
Akụkọ kachasị n'abalị: Obasanjo akpọpụtala Buhari ọzọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu: Mpaghara ọdịdaanyanwụ ga-enweta ụgbọelu agha Ọchị agha elu Naịjirịa bụ Air Marshall Sadiq Abubakar ekwela nkwa iziga ụgbọelu agha anọ n'Enugwu. Abubakar kwuru na ụụbọelu ndị ahụ bụ iji chekwaa steei ndị dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa Akụkọ kachasị na mgbede a: Zionists sị ụmụ Igbo lọta ụlọ Obasanjo na Buhari Aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ekwuola na ọ bụ naanị ndị bụ onukwu ga-ekwu na onyeisiala Muhammadu Buhari emela nnukwu ihe n'obodo a. O kwuru iji gọnarị akụkọ na-agagharị na sọshal midia na Obasanjo na-etozi Buhari na ihe ọ na-arụ. Na mba ofesi Otu mbaụwa bụ UN adọọla aka na ntị ka onyeisiala mba Amerịka ghara ịgbahapụ nkwekọrịta nkwekọrịta ha na mba Iran mere iji kwụsị Iran imepụta ngwọagha nuklia. Onyeisi otu UN bụ Antonio Guterres kwuru na e nwere ike inwe agha mbaụwa ọzọ ma Amerịka pụọ na ya bụ nkwekọrịta Ndị Cambridge Analytica emechiela N'aka nke ọzọ ndị na-enyocha Cambridge analytica ekwuola na ha mechigodi, ọ gaghị akwụsị nyocha a na-eme ha. A na-enyocha Cambridge Analytica maka ebubo izu data gbasara ndị mmadụ na Facebook maka ntuliaka ndị Amerịka mer n'afọ 2016. N'egwuregwu N'egwuregwu otu egwu bọọlụ Liverpool abaala agba ikpeazụ nke asọmpi Champions Lig agbanyeghi na Roma meriri ha. Nke a bụ mbụ ha na-eru n'agba nke ikpeazụ na ya bụ asọmpi kamgbe afọ 2007. Nkeji nke ụtụtụ a Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji. Ihe onyonyo taa Asambodo gị ọ na-enye gị nri? Ụfọdụ ndị Naịjirịa ekwuputela obi ha gbasara Asambodo agụmaakwụkwọ ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị Dino Melaye awụfela oku mkpọghachi Ndị ụka Kraist arụgharịala 'ụlọụka ekwensu' Ụlọikpe anapụla Ugwuonye ikike ịbụ ọkaiwụ
[ "Olusegun Obasanjo", "Facebook", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "UN Security Kansul", "United Nations", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43992912
NAFDAC awakpoola ụlọọrụ anọ maka ọgwụ codeine
NAFDAC kwuru na ha ga-agba mbọ kwụsị ụlọọrụ niile na-akwado mmebi ọgwụ codeine na Naịjirịa.
2018-05-03T16:43:10Z
Codeine: NAFDAC awakpoola ụlọọrụ anọ ma kpachie ọtụtụ ọgwụ
Ndị ụlọọrụ NAFDAC Oge niile ka NAFDAC na-awakpo ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ na Naịjirịa Ngalaba na-ahụ maka nchekwa nri na ọgwụ na Naịjirịa nke akpọrọ NAFDAC n'aha ịchafụ wakporo ụlọọrụ anọ na-emepụta ọgwụ na Lagos, Ilorin na Kano. Mwakpo a, na-eso nchọpụta BBC mere nke gosiri etu ndị mmadụ si emebi ọgwụ ụkwara nwere codeine. NAFDAC kwuru na mwakpo a ha mere, gosiri na ụlọọrụ ndị a ka na-emepụta ọgwụ ụkwara nwere codeine karịrị ọnụọgụgụ iwu ala nyere ha ohere imepụta. Mmachi Codeine: Dextromethorphan aga-ebe okwu? Gọọmenti amachiela ọgwụ codeine Codeine ọtọmegbum: Emzor achụọla ndịọrụ Nwunye onyeisiala etiela mkpu maka codeine Onyeisi ụlọọrụ NAFDAC bụ Mojisola Adeyeye, gwara ndị ntaakụkọ na ugbua, ha na-enyocha ọrụaka ndị ụlọọrụ anọ ahụ BBC gosiri n'ihe nkiri ha. N'ọnụ okwu ya: "anyị akpachiela ọtụtụ ọgwụ nwere codeine n'ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ n'Ilorin. Ụlọọrụ Bioraj Pharmaceuticals kwuru na ha akwụsịla ọnye ọrụ ha bụ Junaid Hassan ọrụ n'ike, Emzor kwukwara na ha achụọla onye ọrụ ha bụ Chukwunonye Madubuike n'ọrụ. Ha abụọ pụtara n'ihe onyonyo BBC dika ndị na-eji azụ aka na-ere ọgwụ codeine. Mana ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na gọọmenti kwesịrị ịta ndị ụlọọrụ a ahụhụ karịa nyocha a na-enyocha ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị: Ụzọ anọ ndị ọrụ ntaakụkọ sị ahụshị anya n'ọrụ. Ụlọikpe ajụla ịhapụ Dino Melaye rue Juunu 11
[ "Ịṅụ ọgwụ", "Ahụike echiche", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43994068
Buhari esila njem US ya wụchie Naịjirịa
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari esila Mba Amerika wụchie Naịjirịa ka ọ kwụsịchara na London.
2018-05-04T06:05:18Z
Buhari esila njem US ya wụchie Naịjirịa
Muhammadu Buhari Buhari na Trump kpara maka ibuso ndị oyi egwu agha Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari esila njem ọ gara na mba Amerika ị leta onyeisiala Donald Trump nata Naịjirịa. Ụgbọelu bụ ya tụrụ na ụlọụgbọelu onyeisiala nke Nnamdi Azikiwe International Airport,Abuja n'elekere 10 nke abali. Ụfọdụ ndị ọrụ gọọmentị gara ị nabata ya. Ọ bụ onye na-ekwuchitere onyeisiala ọnụ bụ Femi Adesina gwara ndị nta akụkọ nke a ka ụgbọelụ ahụ tụchara n'ala. Onyeisiala Buhari ga-aga Amerịka echi Lee ihe ndị Buhari na Trump kpara Ụzọ anọ Buhari jiri yie Trump Buhari onye hapụrụ Washington DC ụbọchị Tusde ka ya na Trump nwechara nzụkọ kwusiri na London. Onye na-ekwuchitere onyeisiala ọnụ nke ukwuu n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu,boro ya bụ nkwụsị nke mberede iji nyocha ụgbọelu kwuru na ọ bụ maka na ugbọelu ndị ukwuu nke onyeisi ji eme njem ka na gabiga ndozi. O kwukwara na Buhari ji obere ugbọelu na-enwechaghi ume ị fe ogogo dị anya eme ya bụ njem, kpatara o jiri kwụsị na ala Britain. Shehu kwuru na nkwụsị ahụ bụ maka ịgbanye mmanụ n'ụgbọelụ ya ma nyocha ụgboelu tupu ọ natawa Naịjirịa. O kwuru na o nweghị ihe rijuru afọ na bụ nkwụsị maka na onyeisiala anatawala Naịjiria. Mana lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na Soshal midia: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Naanị onuku ga-ekweta na Buhari emela ọfụma NAFDAC awakpoola ụlọọrụ anọ maka ọgwụ codeine Ị ma na igbu onye chọrọ ọnwụ bụ njọ na Naịjirịa?
[ "Naijiria", "Njem ụgbọelu", "Njem", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/44036846
Onyeisiala Buhari agala London ọzọ
Onyeisiala Muhammadu Buhari na-aga ịhụ dọkịnta ya onye gwara ya bịa maka nleta na ọgwụgwọ ya.
2018-05-08T05:15:42Z
Onyeisiala Buhari agala London ọzọ maka njem ahụike
Buhari O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-apụ taa gawa London ebe ọ na-anata ọgwụgwọ maka ahụ na-arịa ya. Akwụkwọ onyenkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu dere kwuru na onyeisiala ga-anọ mkpụrụ ụbọchị anọ na ya bụ njem. O kwuru na oge onyeisiala gara London maka mmezi na ịgbanye mmanụ n'ụgbọelu ya oge o si mba Amerịka alọta, ya na dọkịnta ya mere nzụkọ. Buhari esila njem US ya wụchie Naịjirịa Buhari ga-aga njem ọrụ na UK taa Kedụ ihe mere Buhari ji bịa Legọs? O kwuru na dọkịnta ya gwara ya ka ọ bịaghachi nke onyeisiala kwere ya nkwa na ọ ga-abịa. Onyeisiala ga-alọta ụbọchị Satọde abalị iri na abụọ ọnwa a bụ Mee. Shehu kwuru na ọ lọta, ọ ga-aga leta Jigawa steeti, njem e bugharịrị maka nzụkọ ndị APC na wọdụ. Njem ahụ ga-emezi ụbọchị Monde 14 na Tuzde 15 ọnwa a bụ Mee. Cheta na onyeisiala na-anata ọgwụgwọ na London mana ọ gwaghị Naịjirịa aha ihe na-arịa ya. Akụkọ ga-amasị gị: Legos: Ụmụnwaanyị dị ime 2131 na-arịa HIV Achọtala ozu 45 na Gwaska 'Ndigbo agaghị alụ agha nwereonwe ọzọ'
[ "London", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ahụike", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/44036599
Sweet sweet codeine: Nafdac emechiela ụlọọrụ ọgwụ atọ
Nafdac emechiela ụlọọrụ ọgwụ Bioraj, Peace na Emzor maka nkesa ọgwụ ụkwara nwere codeine n'ụzọ na-akwụghị ọtọ.
2018-05-08T06:54:22Z
Sweet sweet codeine: Nafdac emechiela ụlọọrụ ọgwụ atọ na-arụ codeine
Codeine, ọtọmegbum Ọtụtụ ndị ntorobịa na-arịa isimgbaka na ọrịa dị icheiche n'ihi oke ịṅụ ọgwụ ụkwara Ngalaba na-ahazi nlekọta nri na mmepụta ọgwụ bụ Nafdac n'aha ịchafụ emechiela ụlọrụ ọgwụ atọ; Bioraj Pharmaceutical Limited , Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd na Peace Standard Pharmaceutical Limited bụ ụlọọrụ a rụrụ aka n'ihe gbasara ire ọgwụ ụkwara nwere codeine n'ụzọ megidere iwu. BBC wepụtara akụkọ so nchọpụta nzuzo ha meere nke gbara n'anwụ ka ụlọọrụ atọ a si jiri ụzọ azụ ụlọ na-eresi ọgwụ a nke e mere n'iwu ka a na-ere naani oge dọkịta nyere akwụkwọ, nye ndị ntorobịa agharaaghara. Codeine,ọtọmegbum Codeine ọtọmegbum: Emzor achụọla ndịọrụ Gọọmenti amachiela ọgwụ codeine N'akwụkwọ ozi onyeisi Nafdac bụ Mojisola Adeyeye wepụtara, mmechi a sotara nchọpụta ha mere dịka ha gachara n'ụlọọrụ ndị ahụ. "N'ihi e nwetaghị ihe akaebe zuru oke na mbọ igbochi iwepụta akwụkwọ kwesịrị oge anyị mere nyocha anyị n'ụbọchị 2 nke ọnwa Mee, n'ụlọọrụ ha dị n'Ịlorin na Lagos, ọ dị mkpa ka e mechie ụlọọrụ mmepụta ahịa ụlọọrụ atọ ndị a - Peace Standard Pharmaceutical Limited ; Bioraj Pharmaceutical Limited na Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd . Nke a bụ iji nye ohere maka nchọpụta zuru oke." Nafdac na-eme nyocha ndịa maka nchọpụta BBC mere gbasara ọgwụ ahụ Adeyeye kwukwara na imepe ụlọọrụ ndị a ga-agbado ụkwụ ka ụlọọrụ ndị a si nye Nafac nkwado na nyocha ha. O kwuru na otu Nafdac nke gụnyere ndị ọrụ itoolu; abụọ bụ ndị na-enyocha ọgwụ na asaa bụ ndị nchọpụta n-ahụ maka idewe iwu na ndị uweojii iri gara Ilorin n'ụbọchị ahụ, ị ga mee nyocha ụlọọrụ abụọ e nyere ikike ime ọgwụ ụkwara nwere codeine, ndị a kpọrọ aha n'akụkọ nyocha nke BBC wepụtara. Dika Adeyeye siri kwuo, otu ndị ahụ bụkwa ndị e zigara n'ụlọọrụ Emzor na Lagos. O kwuru: "Isi ozi e zigara ha bụ ị ga lele akwụkwọ oriri na nkesa ọgwụ ụkwara nwere codeine nye ndị na-aṅụ ya." O kwuru na Nafdac akpọọla oku nzụkọ ndị ihe gbasara ọgwụ metụtara. Akụkọ ga-amasị gị: Onyeisiala Buhari ga-aga London ọzọ taa 'Ọkaiwu gburu di ya chere ya eche' Legos: Ụmụnwaanyị dị ime 2131 na-arịa HIV
[ "Ịṅụ ọgwụ", "Naijiria", "Ahịa ọgwụ", "Ọgwụ", "Ịṅọgwụ ike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44069810
Bọjeetị Naịjirịa ọ ga-apụta n'ọnwa a?
Ndị mmadu na-ajụ maka akwụkwọ mkpata na mmefu ego nke afọ 2018 nke Naịjirịa na ihe mere ejibeghi wepụta ya.
2018-05-10T15:45:08Z
Bọjeetị Naịjirịa ọ ga-apụta n'ọnwa a?
Onyeisiala Buhari Onyesisala Buhari nyere ndi omeiwu akwukwọ bọjeetị nke 2018 n'ọnwa Nọvemba nke afọ 2017 Mgbe onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nyere ndị omeiwu Naịjirịa akwụkwọ eji hazie etu a ga-esi mee mkpata na mmefu (bụ nke Bekee kpọrọ "budget") nke afọ 2018 n'ụbọchị asaa nke ọnwa Nọvemba n'afọ gara aga ndị mmadụ chere na ha ga-ewepụta ya tupu a banye ọnwa Jenụwarị nke 2018. Ọnwa a nọ n'ime ya ugbua bụ Mee, bụ ọnwa nke ise na 2018, mana ndị omeiwu ewepụtabeghị ya bụ bọjeetị. Ndị ọkachamara n'ihe banyere akụnaụba na-akọwa na etu o siri kwụrụ ugbua ga-eme ka ọ raa Naịjirịa ahụ, okachasị ebe ometụtara ọganihu obodo. Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Achọtala ọfọ sineeti Obiano emeela onye Igala kọmishọna Ndị sinetị akpọọla onyeisi ụlọakụ ukwu Ihe mere ihe a jiri ka njọ bụ na amaghị mgbe ndị omeiwu ga-ebinye aka na ya bụ bọjeetị ma nye ya onyeisiala ka ọ mee ya iwu obodo. Ndị omeiwu sị na ihe mere ha ejibeghi wepụta 'bọjeetị 2018' a bụ maka ngalaba gọọmentị dị icheiche ewetabeghị nkọwa etu ha sị chọọ ime mkpata na mmefu nke ha, n'agbanyeghị na akwụkwọ ndị omeiwu ji nwere nhazi etu ngalaba dị icheiche kwesịrị isi mee ego na 2018. Mana ngalaba na-ahụ maka nhazi, - nke a na-akpọ Ministry of National Planning n'asụsụ Bekee - kwuru na ihe niile ndị omeiwu kwesịọrị iji hazie bọjeetị dị n'ime akwụkwọ enyere ha. Ben Akabueze, bụ onyeisi ngalaba na-ahazi mkpata na mmefu kwuru na ihe niile ndi omeiwu chọrọ dị n'akwụkwọ onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ndị omeiwu n'ọnwa Nọvemba nke afọ gara aga. Mana, ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị omeiwu na-akpọ ndi isi ngalaba dị icheiche ka ha bịa zara ọnụ ha, nke bụ ihe ya ma na emeela. Ihe ọ pụtara Ndị ọkachamara n'ihe banyere akụnaụba obodo na-ekwu na Naịjirịa agaghị ahazi akụnauba obodo ọfụma ma ya bụrụ na bọjeetị a apụtaghị. Na soshal midia di ka Twitter, ndi mmadụ na-ekwu maka ihe na-eme. Onye ji akara @AdeBanqie ede na Twitter dere na ndị Naịjirịa kwesiri ikwu na ndị omeiwu agaghị arụnwụ ọrụ n'ọchịchị onye kwuo uche ya. Ụlọọrụ na-enyocha etu gọọmentị jiri agbari "budget" bụ BudgIT dere na ọ bu nke afọ a kachasi tee aka kemgbe ebidoro ihe banyere bọjeetị na Naịjirịa. @OduObodumu na-ajụ ma onwere obodo ọzọ akwụkwọ mkpata na mmefu notegoro aka ruo etu nke afọ a ruru. @Purrples sị na ya na-akpọ onyeisi ndị omeiwu ukwu ka ọ bịa zara ọnụ ya maka akwụkwọ mkpata na mmefu a. Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ @ApanpaOlasumbo bụ onye na-ajụ ihe mere ndị Naịjirịa ejighị ekwu okwu maka ihe a na-eme. Ka ihe ndị na-eme, ndị omeiwu na-ekwu na ha ga-ebinye aka na ya bụ akwukwọ n'ụbọchị 16 nke ọnwa a, mana ọbụghị mbụ ha kwuru etu a, nke mere anyi ji ajụ, "agbu ji agu ọ ga-arapụ ya ugbua?". Akụkọ ga-amasị gị: Ihe na-akpa m bụ nchekwa na akụnaụba obodo Etu ndị Sinetọ si agbari ego Naijiria Ndị mahadum IMT majara onye ntaakụkọ BBC
[ "Naijiria", "Akụ na ụba", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44079283
Ihe APC mere PDP ọ ga-eme ha na 2019?
Otu CNM Obasanjo akwadola pati ADC nke ndị mmadụ na-ajụ ma ha a ga-eme APC ihe APC mere PDP na 2013.
2018-05-11T11:46:21Z
Ntuliaka 2019: Pati ADC ọ ga-emegwara APC ihe ha mere PDP?
Olusegun Obasanjo N'afọ 2013, otu pati anọ na Naịjirịa kpokoro ọnụ mee otu pati iji kwatuo patị PDP bụ ndị nọ n'ọchịchị oge ahụ. Pati APC na mbụ na ndụ Naịjirịa kamgbe ndị nkịtị were ọchịchị n'afọ 1999 napụrụ onyeisiala nọ n'ọchịchị ọkwa dịka ha meriri na ntuliaka 2015. Oge ahụ ka Muhammadu Buhari nara Goodluck Jonathan ọchịchị. Otu Obasanjo kpokobara abala ndọrọndọrọ Atiku etinyela ụkwụ na ndọrọndọrọ 2019 'Ntuliaka 2019 ga-adịkwa kpọkpọnki' Pati ndị mere APC Pati anọ bụ ndị mebere otu pati APC n'afọ 2013. Pati ndị ahụ bụ ndị chere na ihe onyeisiala Jonathan na-eme oge ahụadighi ha mma. Pati ndị ahụ bụ: Otu pati Action Congress of Nigeria ACN n'aha ịchafụ nke onyeisi ha bụ Bola Ahmed Tinubu Otu Congress for Democratic Change CPC n'aha ịchafụ bụ otu pati onyeisiala Buhari nọ n'isi ya oge ahụ Otu pati All Nigeria People's Party bụ pati Buhari jiri zọọ ọchịchị n'afọ 2003, onyeisi ya bụ Edwin Ume-Ezeoke Otu All Progressive Grand Alliance nke ụfọdụ n'ime pati ahụ obi na dịghị mma kewara sonyere ndị otu a kpokoro ọnụ. N'ọnwa Novemba afọ 2013, gọvanọ ise nọ na PDP hapụrụ pati ahụ banye APC ebe ndị sinetọ ruru mmadụ 49 mekwara etu ahụ nke mere APC jiri merie ọchịchị n'afọ 2015. PDP chịrị Naịjirịọ́ afọ iri na isii tupu APC anara ha ọchịchị Nke na-eme ugbua Aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo dọkara akwụkwọ kaadị gosiri na ọ bụ onye otu pati PDP kwuo na ya anọghịzi n'otu pati ọbụla. N'ọnwa Jenuwarị afọ a, Obasanjo bidoro otu ọhụrụ nke ọ kpọrọ Coalition for Nigeria Movement CNM n'aha ịchafụ nke o kwuru na ọ bụghị otu pati mana ụnyaahụ, otu ahụ kwupụtara nkwado ha nye otu pati ADC maka ntuliaka 2019. APC were ọchịchị n'afọ 2015 Pati ADC a ọ chọrọ ime ihe APC mere na 2013? APC bụ pati kpokoro pati ndị we merie ọchịchị ma Obasanjo kwuru na ha chọrọ inye ndị APC ọsọ, nke pụtara na ha nwereike ikwatu APC etu APC si kwatuo PDP. Ụfọdụ ndị gọvanọ nọ n'APC na ekwupụta iwe ha gbasara ọchịchị ndị APC ebe ụfọdụ ndị omeiwu dịka onyeisi ndị sineti na ndị pati APC na-akwata ya kamgbe. Ọ bụrụ na ndị a iwe na-ewe kpebie ịpụ na APC, ha nwereike laghachi PDP maọbụ banye pati ọhụrụ ahụ ebe Obasanjo nọ nke ga-enye ADC ụdị ikike APC nwere oge nke ya. Ihe ndị ị na-amaghị maka CNM na pati ADC Ha ji ụdị ihe osise a na-ajụ ụmụ Naịjirịa ajụjụ gbasara etu ngalaba dị icheiche na Naịjirịa si eme Obasanjo kpokobara CNM ebe aka chịburu Ondo steeti bụ Olagunsoye Oyinlola sikwa PDP pụọ bụ onyeisi ha CNM nwere mmadụ karịrị nde atọ debanyerela aha na pati ahụ Ihe ruru pati 68 chọrọ ikpoko ka ha na CNM bụrụ otu CNM akwadola otu pati African Democratic Party nke bụ ADC n'aha ịchafụ ADC bidoro n'afọ 2006, onye zọrọ ha ọchịchị bụ Pat Utomi n'afọ 2007 PDP kwuru na ya na ADC na pati ndị ọzọ na-anọghị n'ọchịchị ga-ejikọ aka chụpụ onyeisiala Buhari na ndị APC na 2019. Onye na-ahụ maka mgbasaozi n'APC bụ Bolaji Abdullahi kwuru na-agbanyeghi na CNM na ADC kpokoro, ya mara na ụmụ Naịjirịa ka nwere ntụkwasị obi n'otu ya APC. Ihe a niile na-eme na-egosi etu ntuliaka 2019 ga-esi gaa na ihe ihuigwe ga-adị ka ya oge ahụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe na-akpa m bụ nchekwa na akụnaụba obodo Etu ndị Sinetọ si agbari ego Naijiria Ndị mahadum IMT majara onye ntaakụkọ BBC
[ "Olusegun Obasanjo", "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "All Progressives Congress", "PDP (People's Democratic Party)" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44043539
I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo?
Igbuichi bụbụ ihe ejiri mara Igbo na ndị agbụrụ ọzọ maka ogo, ọkwa maọbụ ugwu. N'akụkọ a, mata maka ichi dị icheiche.
2018-05-11T17:09:19Z
Ichi e gburu mgbe gboo
Igbuichi Ọtụtụ mmadụ nwụrụ maka ịgbuichi a Ọ ga-atụ gị n'anya, mana foto a na-egọsị ụdịrị ichi ndi mmadụ na-egbu n'ala Igbo mgbe gboo. Ịgbuichi dị ụzọ abụọ ama ama. Otu bụ ụdịrị ndị Nri na echi, nke ọzọ bu nke ndị Agbaja. Ichi Nrị na-ewu bu na gbụrụgbụrụ Ọka bu obodo di na Anambra steeti ugbua, nke Agbaja si na gbụrụgbụrụ Ọgwụ nke dịzị na Enugwu steetị. N'ime akwụkwọ akpọrọ Journal of International African Institute na Bekee, ha kọwara na ndị Igbo anaghị egbu ichi maka ị gosi ebe onye gburu ya sịrị bia. Ihe ndị ị na-ekwesịghị ime n'akụkụ onye Igbo 'Aguleri na Igboukwu abụghị mbido Ndigbo' Ihe ndị ị kwesịrị ịma tupu ị lụọ nwaanyị Igbo Ọ bụ maka igosi ogo, ọkwa maọbụ ugwu, na ị gosi na onye ahụ abaala otu ndị ọzọ. Ha na-akpọ ndị gburu ichi ndịnze maọbụ ndịichie. Naanị ndị dị ike ga-egbụ ichi Dịka omenaala siri kwu, ọ bụ sọọsọ ndị gburu ichi ga-emeri ọnwụ. N'oge ahụ, ha nwere nkwenye na ndị gburu ịchị ga-ebi ebeebe n'ala ndị mmụọ. Ndị gburu ichi anaghị arụ ọrụ dịka ndị ọzọ, ha anagị ebu ihe ọbụla n'elu isi ha. Ọ bụ arụ ị chọ ha okwu obụla maọbụ kpaso ha iwe. Igbuichi dị icheiche n'ala Igbo Ọ dị ezigbo mkpa ka ọnwa na anyanwụ dị n'ichi ọbụla ha ga-echị. Ọnwa na-ebụrụzọ, anyanwụ na-esote ya, nke atọ ga-abụ ichi ahụ. Ogbanje Otụtụ ndị igbo nwere nkwenye na Ogbanji ka dị ire Igbuichi ọzọ ha na-egbu bụ maka ụmụaka ha chere na ha bụ ogbanje. Dịka omenaala siri kwu, ha na-egbu ha ichi a ka mmụọ ogbanje naghị mata ha ma ọ bịa ọzọ. Ọzọ bụ igbu ichi maka ntị fụrụafụ. Ndị Igbo nwere nkwenye na igbuichi a ga-eme ka ntị ọbụla fụrụafụ gba mmee nakwa da ba n'ime. Ị ma uru ọjị bara n'ala Igbo? Ihe ndị ị na-ekwesịghị ime n'akụkụ onye Igbo Etu e siri egbuichi Ọ bụ n'isi ụtụtụ ka onye chọrọ ị gbu ichi ga-ebilite, pụọ n'iro, dina n'ala cheli ihu ya elu. Ha ga-eji mma toro ogologo dị nkọ gbuo ichi a. Ọ bụ arụ ka onye ahụ bee akwa, maọbụ tie mkpu mgbe a na-egbu ya ichi a. Onweghị ihe ọbụla ha ga-enye ya maka ị nye aka ịdị ụfụ maọbụ ị kwụsị ọbara ga-agba n'oge igbu iche a. Igbuichi a bụ maka ị chọ mma Onweele ndị nwụrụ mgbe a na-egbu ha ichi, otụtụ ndị ọzọ kpuru isii maka ihe a. Ọ bụrụ na onye ha na-egbu ichi bee akwa, e nwere ike ị napụ ya akụnaụba ya. Ebe anaghị egbuichi n'ahụ mmadụ Anaghị egbu ichi na obi, uvu maọbụ n'ụkwụ, ọ bụ sọọsọ n'ihu na afọ ka ha na-egbu ichi. Igbuichi bụ ihe ogo Ihe kwụsịrị igbuichi Ugbua, onweghị onye ị ga-ahụ gburu udịrị ichi a na egbu mgbe gboo. Onya ọkammụta aha bụ Chigozie Nnabuihe kwuru na ndị niile gburu ichi a anwuchaala. O kwukwara na ọbịbịa ụka otu Kraịst mere ka ọtụtụ mmadụ kwụsị igbuichi. N'ime akwụkwọ Journal of International African Institute, otu nwoke a jụrụ ajụjụ kwuru na ụmunwoke ugbua anaghị enwe ike idi ụfụ ga-apụta na igbu ichi a. Otu Obasanjo kpokobara abala ndọrọndọrọ Onye odee akwụkwọ ndi otu CAN awụọla
[ "Naijiria", "Omenala" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44079941
Ogbaghara adaala na Pọtakọt
Akụkọ na-ekwu na ọ na-akpọtụ n'obodo pọtakọt ebe a na-azọ ihe ga-eme n'ikpe ntuliaka imeụlọ nke APC.
2018-05-12T10:27:49Z
Ụda egbe na-ada n'isi obodo Rivas steeti
Egbe Echere na ọ bụ ndị agboro na-agba egbe a Akụkọ na-apụta kwuru na ụda egbe dara n'ụtụtụ a na Pọtakọt Rivas steetị. Onye ntaakụkọ BBC Igbo gwara okwu n'ekwe ntị bu Victor Eziahama kwuru na ọ bụ ndị agboro APC gbochiri ụzọ ụlọịkpe ga-ekpe maka ntuliaka imeụlọ nke APC ga-eme echi n'obodo ahụ. Mmadụ abụọ anwụọla na ntuliaka APC Ọgbaaghara APC: Oyegun asaala Tinubu Ntuliaka imeụlọ APC: Gịnị ga-eme ugbua? Ndị nche nọ n'ụlọikpe ahụ malitere ị gba egbe maka ị chụsa ndị ahụ bịara ị bido nsogbu, ụlọịkpe ahụ gara n'iru ịkpe ma nye iwu gbasara APC Eziahama si na Ọkaikpe Chinedu Nworgu nyere iwu na ntuliaka imeụlọ APC na-akwado agaghi eme maka ebubo aka-azụ na-aga n'ime otu ahụ. Ụfọdụ ndị nọ ebe ihe a mere kwuputara ya n'elu soshal midia nke Twitter: Nke a tipuru mkpu na mbido ọgbaaghara ahụ: Nke a gosiri ụfọdụ ụgbọala emebiri n'okwu a: Onye kwuputekwara ebum nuche ya maka ihe mere: Echi ga-ekwu ma APC a ga-ada iwu ahụ maọbụ ha ga-ejigide ya. Cheta na ntuliaka imeụlọ nke otu APC mere n'ụbọchị satode gara aga ghọrọ ihe ọgbaghara maka mwakpo mere na mmadụ abụọ nwụrụ n'ebe dị ịcheịche. Akụkọ ga-amasị gị: Otu Obasanjo kpokobara abala ndọrọndọrọ Ihe APC mere PDP ọ ga-eme ha na 2019?
[ "Naijiria", "All Progressives Congress", "Riva steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44105573
Ogbunigwe agbaala n'Enugwu steeti
Ihe e chere na ọ bụ obunigwe agbaala n'ime otu ụlọụka Katọlik n'obodo Iji-Nike n'Enugu steeti.
2018-05-14T10:21:37Z
Ogbunigwe agbaala n'ime ụlọụka n'Enugwu steeti
Ụlọụka ndị Katọlik E chere na ogbunigwe a gbara n'ụlọụka katolik si n'oge Agha Biafra Ụfọdụ mmadụ n'obodo Iji-Nike kọwara ka ha siri nụ ụda ihe ha chere na ọ bụ ogbunigwe n'obodo ha ụnyaahụ. Ogbunigwe ahụ gbara n'ime ụlọụka Holy Cross Catholic Church dị n'obodo ahụ ihe dịka Elekere ise nke ụtụtụ mara ebe niile jijiji mana o nweghi onye nwụrụ. Fada Emmanuel Okwor bụ ụkọchụkwụ na-achịkọta ụlọụka ahụ kwuru na ihe a mere mgbe ọ na-akwado idu mass n'ụtụtụ ụbọchị ụka. A gbala ogbunigwe n'ụlọ Nwodo Ogbunigwe egbuola mmadụ 28 na Mubi Ọ sị "nke a butere ọgbaaghara ma me kwa ka ụfọdụ ndị mmadụ gbapụ ọsọ ga zoo onwe ha". Bishọpụ Enugwu bụ Callsitus Onaga agaala ebe ihe a mere ma na-ekwu na nke a kwesiri i mee ka onye ọbụla kpachara anya ha. Ọ sị na ọ bụrụ na ihe a mere mgbe ndị mmadụ nọ n'ụlọọka na ọ kara ibute nsogbu ebe ndị mmadụ na-agba ọsọ. Amaghị ụdị ogbunigwe gbara n'ebe ahụ Akụkọ ka na-abịa.
[ "Ụka ndị Roman", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44129845
Akụkọ kachasị n'abalị: 'Gọọmentị gbakọtara anyị azụ' - Nne Leah Sharibu
Nne Leah Sharibu ka na-ele anya ma nwa ya ọ ga-apụta n'aka ndị Boko Haram nwụchiri ya ka o ruola ụbọchị 84 ọ nọ n'aka ha.
2018-05-15T18:08:21Z
Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: 'Gọọmentị gbakọtara anyị azụ' - Nne Leah Sharibu
Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a: Ndị Boko Haram gara ụlọakwụkwọ Dapchi na Febụwarị afọ a Nne Leah Sharibu, bụ nwata akwụkwọ ndị Boko Haram tọọrọ na Dapchi ma jụ ịhapụ maka na ọ bụ onye ụka Kraịst, ekwuola na ndị gọọmentị gbakọtara ya azụ. Nwaanyị a kwuru sị "naanị ndị otu nzukọ Kraịst na-abịa ileta anyị. Enweghị onye si gọọmentị. Anyị nọọrọ onwe anyị." Ebe ọzọ na Naịjirịa Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọala na Naịjirịa ekwuola na atọrọla ihe karịrị mmadụ iri asatọ na mpaghara Kaduna steeti. Ndị uweojii kwuru na ọ bụghị eziokwu na atọrọla ọtụtụ ndị mmadụ dịka ndị njem a si kwuo, mana enweela ndị atọrọla n'akụkụ ebe ahụ na nso nso a. Na mba ofesi, A tụọla nwoke dị afọ iri abụọ na isii nga mkpụrụ ọka afọ narị abụọ na iri ise na Saụt Afrịka. Ikpe mara nwoke a bụ Shadrax Xidada Chauke maka ebubo mwakpo n'ike iri abụọ na atọ na ịnwa igbu mmadụ ugboro abụọ nakwa izu ohi na ịtọ mmadụ. N'egwuregwu, Naịjirịa na mba Congo, England na Czech tupu e bido asọmpị iko mbaụwa n'ezie Otu egwuregwu Naịjiria bụ 'Super Eagles' tozuru isonye n'asọmpị iko mbaụwa ga-eme na Rọshịa n'ọnwa Juun ebidola nkwado asọmpị ahụ. Akụkọ na-ekwu na ha ga-ebido ọzụzụ ha n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke Mee n'ọgbọ egwuregwu dị n'obodo Uyo, nke bụ isi obodo Akwa Ibom steeti. Cheta na ndị NFF na onye nchịkọta otu Naịjirịa bụ Gernot Rohr wepụtara aha mmadụ atọ ga-eso asọ mpi a na Rọshịa. Gee nkeji anyị na mgbede a: Ihe nkiri taa Patrick Utomi gwara BBC Igbo ihe atọ dịkarịchara mkpa ọ chọrọ imezu ma ọ bụrụ gọvanọ na Delta steeti.
[]
https://www.bbc.com/igbo/media-44129846
'Ihe m gabigara n'aka ndị ntọ'
Maazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ.
2018-05-15T21:07:40Z
Ihe m gabigara n'aka ndị ntọ
Maazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ oge atọrọla ya n'ụzọ Okada dị n'Edo steeti ka o si Legọs na-aga Enugu n'afọ 2017.
[ "Naijiria", "Ọgụ ndị na-achịehi", "National security" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44135408
'Gọọmenti ga-eji N10bn dozie steeti ọchịehi mebiri'
Gọọmenti etiti ekwuola na ha ga-etinye ijeri naira 10 na idozi Benue steeti na steeti ndị ọzọ ndị ọchịehi mebiri ihe.
2018-05-16T05:39:09Z
Osibanjo: Gọọmenti ga-etinye N10bn na idozi steeti ọchiehi mebiri
Ọkammụta Yemi Osibanjo Osote onyeisiala Yemi Osibanjo,onye ụkọchụkwụ ụka 'Redeem' bụ Ọkammụta iwu Osote onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osibanjo kwupụtara na gọọmenti etiti etinyela aka na akwụkwọ maka mmapụta ijeri naira 10. O kwuru na a ga-eji ego a ịrụgharị ma wugharịa obodo ndị nsogbu Fulani na-achiehi na ndịọrụ ugbo metutụtara na Benue steeti na a steeti ndị ọzọ. Osibanjo kwuru nke a n'ụbọchị Tuusde oge ọ gara nleta na ebe ndị gbara ọsọ mndụ nọ na Abagana na daudu dị na okpuru ọchịchị Makurdi na Guma dị na Benue Steeti. O kwuru na ọnọdụ ndị gbara ọsọ ndụ n'ihi ọgbara ahụ na-echu onyeisiala Muhammadụ Buhari ụra. Ortom: Ihe m jiri kpụpụ Miyetti Allah ụlọikpe Uweojii: Anyị anụghị ihe Ortom Kwuru "O nwere ihe ndị a chọpụtarala; nke mbụ bụ nchekwa. Anyị chọrọ ịgba mbọ ịhụ na ebe ndị e mebiri na e chekwara ya. "Nke abụọ bụ bụ ịgba mbọ hụ na ndị gbara ọsọ ndụ laghachiri na be ha, alụgharịala . "Nke atọ na ndị ọrụugbo laghachiri na ugbo ha nakwa na enyere ma ndị abụghị ndị ọrụ ugbo aka ibido ndụ ọzọ." Ọ gara n'ihu kwa ha na a mapụtala ego a ga-eji belata ahụhụ ha na-ata sị, "A bịara m ịgwa ụnụ na gọọmenti ala Naijiria nwere ike ichekwa ụnụ ma gbooo mkpa ụnụ, na anyị na ezipụkwu ndị ọrụ nchekwa ka ha chekwaa ụnụ." N'okwu ya ya, Gọvanọ Benure bụ Samuel Ortom rịọrọ ka gọọment tinyekwuo uchu na nchekwa mpaghara ahụ " Ọ masị ndị ogbuọbara a si Libya, Boko Haram maọbụ ndị na-achị ehi, sị tinyekwuo nchekwa iji kpochapụ ha na steeti a ka ndị mmadụ nwee ike ịlaghachi na be ha." Odeeakwụkwọ ngalaba na-ahụ maka gbatagbata na steeti ahụ nke a kpọrọ State Emergency Management Agency (SEMA), bụ Emmanuel Shior, kọwara na ebe ndị gbara ọsọndụ nọ n'Abagana nwere mmadụ ipuku iri atọ na ano, narị itoolu ,iri atọ na isii(34,936) si Benue na Nasarawa steeeti gbaa ọsọ ndụ oge e mepere ya na ọnwa Februwarị mana ugbua e nwere mmadụ puku iri na abụọ, iri anọ na otu (12,041) ebe ahụ. O kwukwara na achịkọta ọnụọgụgụ ndị nọ na ebe mgbata ọsọ ndụ asatọ dị na steeti ahụ, bụ mmadụ otu narị, iri asaa na ise, iri na asaa (175,017.) Akụkọ ga-amasị gị: Ejighi ọnụ agwa Igbo na ụzọ dị mma - Ohuabunwa Ụmụigbo nọ UK alụọla ọgụ maka onye nna ya ka nwe ego Afọ ole ka ị ga-ebi n'ụwa? I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo?
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/44135409
Ụlọomeiwu ejirila N500bn bulite bọjeti
Ụlọomeiwu nke etiti ebuliela egọ bọjeti afọ site na N8.612tn ga N9.120tn, mmanyekwu N500bn.
2018-05-16T07:07:29Z
Ụlọomeiwu ejirila N500bn bulite bọjeti
Ụlọomeiwu Sineti Buhariwepụtara ndị ụlọoimiwu Bojet afọ 2018 ọnwa isi gara aga. N'ụbọchị Tuusde, Ụlọomeiwu ukwu na nke nta wepụtara Bọjeti nke afọ 2018, ebe ha bulirị ego gọọmenti ga-emefu n'afọ site na tarịị naira 8.612 ga tarịị naira 9.120, nke pụtara mmanyekwu ijeri naira 500. Mgbari ego ahụ nke pụtara N9,120,334,988,225, gọsiri na e hiwere N530,421,368,624 maka nkesa dị na iwu ( Statutory Transfers). E hiwere N2,203,835,365,699 maka ịkwụ ụgwọ eji eji(Debt Service nke ọnụego N190,000,000,000 bụ maka ụgwọ ruola ọkwụkwụ. Enugwu steeti ekewapụtala ijeri naira 103 maka 2018 Ụlọomeiwu abụọ akpọọla Buhari oku E hiwerekwara N3,516,477,902,077 maka ego mmefu ego a na-eme kwa mgbe kwa mgbe (Recurrent Expenditure.) Ha hiwekwara N2,869,600,351,825 dịka ego maka imepụta mwulite doro anya( Development Fund for Capital Expenditures) n'afọ ga-akwụ ma ọnwa Disemba gba iri ato na otu. Cheta na gọọmenti etiti wegara ndị ụlọoimewu Bojeti afọ 2018 ọnwa isi gara aga. N'ụlọomeiwu nke ukwu onye bupụtara akwụkwọ Bọjet bụ onyeisioche kọmitii lebanyere ya anya bụ Sinetọ Danjuma Goje. N'otu aka ahụ, Mustapha Bala Madaki bụ onye bupụtara akwụkwọ ahụ na'ụlọomeiwu nke nta. Ọnụ na-ekwuchitere Sineti bụ Aliyu Sabi Abdullahi kwuru n'izuụka gara aga na aga-ebuta ya na Tuusde ma tulee ya na Wenezde, ebe ha ga etinye aka n'akwụkwọ ahụ na Tọọsde. Osote onyeisi Ụlọomeiwu nta bụ Yussuff Lasun, kwuru na ha ga-atulee Bojeti na Tuusde ma tinye aka na ya n'Wenezde mana ọ bụrụ na ha emepụghị ya, ha ga-emezu itiinye aka n'akwụkwọ ahụ na Tọọsde. Akụkọ ga-amasị gị: Ejighi ọnụ agwa Igbo na ụzọ dị mma - Ohuabunwa Ụmụigbo nọ UK alụọla ọgụ maka onye nna ya ka nwe ego Afọ ole ka ị ga-ebi n'ụwa? I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo?
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44125614
A kpọpụrụ Zakzaky ụlọikpe
Ahụrụ Ibrahim Zakzaky n'ihu taa ka gọọmentị kpọrọ ya ga ụlọikpe na Kaduna taa.
2018-05-16T07:25:08Z
A kpọpụrụ Zakzaky ụlọikpe na Kaduna
Zakzaky Zakzaky mgbe a kpọtara ya n'ụlọikpe E highariala ikpe onyeisi ndị Shi'a na Naịjirịa bụ Ibrahim el-Zakzaky n'ọnwa Juun 21. A kpụpụtara el-Zakzaky na nwunye ya n'ụlọikpe dị na Kaduna n' ụbọchị Tuuzde. Ndị kpọrọ Zakzaky gawa ụlọikpe bụ gọọmenti Kaduna bu ndị na ebo ya ebubo na o gbụrụ onye agha Naịjirịa mgbe ndị na eso ya na ndịgha nwere nsogbu n'afọ 2015. Gọọmenti etiti ọ na-ahọrọ mkpebi ụlọikpe? Akụkọ dị mkpa taa: Tọghapụ Elzakzaky - Shiite Anyị nwụchiri ndị Shiite 115- Uweojii Mmadụ abụọ ọzọ eji aka bụ Yakoub Yahaya Katsina na Sanụsi Abdulkadar Koki apụtaghị n'ụlọikpe ta. N'ụlọikpe, agụọrọ Zakzaky ebubo a na-ebo ya, mana o kwuru na aka ya adịghi na ya. Maxwell Kenyon, bụ onye ọkaiwu Zakzaky, si ka ulọikpe nye ohere igbapụta ya na mkporo, mana ọkaikpe ekweghị. Ọkaikpe Kurada si ka Kenyon de ihe ọchọrọ ede. Onye nọchịtere anya ndị gọọmentị Kaduna sị ka ụlọikpe kwere ka DSS ka jide Zakzaky. Ọlụikpe kwenyere na nke a, sị ka akpọghachie Zakzaky Abuja. Ụlọikpe gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ n'ụbọchị 21 nke ọnwa Juun ka ha ga etinye ọnu ọzọ n'ikpe a. Mana, ndị Shi'a si na ha ekweghị n'ije a mere. N'akwụkwọ ha dere, Abdulhamid Bello, bu otu n'ime ndi isi ha, kwuru na ha ga aga n'ihu na-eme ngaghari iwe ha. "Ọ bu gọọmentị etiti ka anyị ga ata ụta ma ya bụrụ na onwere ihe mere Zakzaky," Bello kwuru.
[ "Kaduna", "Islam", "Kaduna steeti", "Naijiria", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44135619
Akụkọ kachasị taa: Nọt Koria chọrọ ịgbaha ọgbakọ ha na Amerịka
Mba Nọt Koria na-ekwu na ha nwere ike hapụ nzụkọ ga-adị n'etiti ha na Saụt Koria ma ọ bụrụ na Amerịka gaa n'ihu ịkwanye ha ọkụ n'ike maka ngwaagha nụklịa.
2018-05-16T08:26:35Z
Akụkọ kachasị taa: Nọt Koria chọrọ ịgbaha ọgbakọ ha na Amerịka
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ụlọịkpe pụrụịche na-ahazi ka onye si-eme n'ọrụ gọọmentị bụ Code of Conduct Tribula na bekee, ekwuola na o nweghị ihe Jostis Sylvester Ngwuta mere. Nke a bụ maka okwu gbasara ekwupútaghị akụ na ụba ya ha n'ezie. Ebe ọzọ na Naịjirịa... Gọọmenti etiti ekwuola na ha ga-etinye ijeri naira 10 na idozi Benue steeti na steeti ndị ọzọ ndị ọchịehi mebiri ihe. Osote onyeisiala Yemi Osibanjo,onye ụkọchụkwụ ụka 'Redeem' bụ Ọkammụta iwu Ọkammụta Yemi Osinbajo bụ osote onyeisiala Naịjirịa kwuru nke a ebe ọ gara nleta iti aka n'obi na Benue steeti. N'otu aka ahụ, akpụpụla onye ndu ndị Shiites n'ụlọịkpe ịzara ọnụ ya maka ebubo ịbute ọgbaaghara n'obodo. Cheta na e jichiri ya na nga kemgbe afọ 2015. Akụkọ ofesi Onyeisiala mba Nọt Koria na-ekwu na ha nwere ike ị gbahịị nzụkọ ga-adị n'etiti ha na mba Amerịka ma ọ bụrụ na Amerịka jisike na-akwanye ha ọkụ n'ike maka ngwa agha nụklịa ha. Kim Jong-un na Donald Trump kwesiri ị zuko n'ụbọchị 12 nke Jun n'obodo Singapore ị kpa maka odinihu mba ha abụọ. N'Egwuregwu, Ebe niile kwuru jim n'ọgbọ egwuregwu villa park ụnyaahụ Nke a bụ iji kwanyere onye ọgba bọọlụ ọchie otu Aston Villa Jlloyd Samuel nwụrụ na mberede okporoụzọ. Gee ya nkeji nke ụtụtụ a: Ihe onyonyo nke taa:
[ "United Kingdom", "Naijiria", "Egwuruegwu", "North Korea", "Amerika", "Benue steeti", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44144615
Lee uwe ndị Igbo na-eyi aga igba nkwu
Ịlụ di maọbụ nwaanyị bụ ihe dị mkpa n’ala Igbo. Kedụ ụdị uwe ọ ndị be anyị na-eyi?
2018-05-16T18:31:54Z
Uwe anyị na-eyi agba nkwu
Ejiji ndị ndị Igbo pụụ iche nke ụkwuu Ejiji ndị ndị Igbo pụụ iche nke ụkwuu Ịlụ di maọbụ nwaanyị bụ ezigbo njem na ndụ mmadụ. Ọ bụ ihe mmadụ ole n'ole chọrọ ijide aka tupu ha ahapụ ụwa. N'ala Igbo, nwoke gara ịlụ nwaanyị ga-amara na ọ bụghị sọọsọ nwunye ya ka ọ na-alụ. Ọ na-alụkwa ndị be ya niile. N'otu aka ahụ, nwaanyị na-alụ di na-alụkwa ndị be ya. N'ihi nke a, onye ọbụla siri n'ezinụlọ ha abụọ na-etinyekọta aka ịhụ na mmemme gbasara ndị a na-achọ ịlụ onwe gara nke ọma. Okporoụzọ Umunya ọ nyịala gọọmentị idozi? Ịdịnotu ọdịla n'ala Ozalla? Ihe ukwu nke dị n'alụm di na nwunye bụ uwe ha ga-eyi n'ahụ makwa nke ndị ga-abịanụ ga-eyi. Ndị a bụ uwe dị icheiche ndị be anyị na-eyi n'ala Igbo. Ejiji pụrụ iche Uwe nwaanyị na-alụ dị na-adị iche maka ọ bụ ya ka onye ọbụla ga-ekiri ụbọchị ahụ. Nke nwoke na-apụkwa iche nke ya. Ọ bụnwaanyị ka onye ọbụla ga-ekiri ụbọchị ahụ. Ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-eme ịgbankwu na-eyị uwe elu na nke mwụda. Ọbụghị iwu na uwe a ga-enwe otu agwa, mana agwa akwa nwaanyị ga-eyi ga-emejurịta ibe ya. Aka uwe elu a nwere ike ịkwụsị ebe ọbụla. E nwere ike iji ọla akwa dị icheiche achọ ya mma. Uwe mwụda bụ ụdịrị akwa na-amasị ndị ibe nke nwunye na ndị agbọghọ bịara mmemme a. Ndị nwaanyị lụrụla di na-adị ama akwa n'ukwu. Ndị nwoke na-eyi uwe elu na traụza. Ụfọdụ na-ama akwa n'ụkwu. Uwe isi Nke a bụkwa uwe ọzọ dị mkpa n'ejiji alụm dị na nwunye dịka omenaala Igbo sịrị dị. Ọdụ ịnyịnya, okpu na ọla olu bụ ụfọdụ ihe eji achọ mma Nwaanyị nwere ike ịsụ ịchafụ n'isi. E nwere ike itinye ola uwe n'ịchafụ nke nwaanyị ka ọma ezigbo mma. Nwoke na-ekpu okpu isi. O nwere ike ịbụ okpu na-acha uhie uhie, edo na ndị ọzọ. Ọla, akpụkpọ ụkwụ na ihe ndị ọzọ Uwe a na-eyi n'igba nkwụ nwaanyị anaghị ezu oke ma ọbụrụ na ola dị icheiche adịghị na ya. Ọla ọcha, ọla edo, kọral, ọdụ na ọla a na-etinye n'akwa. Ha juru eju. Nwaanyị na nwoke na-agba uwe olu na nke aka. Ọzọkwa, nwaanyị na nwoke nwere ike iji ọdụ ịnyịnya. Nwaanyị nwekwara ike iji akụpe n'aka ma ọ chọọ. Abịa na akpụkpọ ụkwụ, ndị nwaanyị na-eyi akpụkpọ ụkwụ mara mma. Ufọdụ na-eyi nke dị elu maọbụ nke ala ka ha nwe ohere ịgba egwu. Nke ndị nwoke bụ nke e ji akpụkpọ anụ mee. Mkpọrọ na-eme ka ejiji nwoke N'ikpeazu, nwoke nwere ike jide mkpọrọ o ji aga ije. Akụkọ ndị ga-amasị gị: I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo? Ihe ndị ị na-ekwesịghị ime n'akụkụ onye Igbo Uru nwaanyị abụghị sọ n'ụsọekwu
[ "Omume", "Ezinụlọ", "Mmegbu", "Alụmdịnanwụnye" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44156520
Bọjetị 2018 ọ ga-enyere ndị ntoroọbịa aka?
Ka emechara binye aka na Bọjetị nke Naịjirịa anyị na-ele anya ịhụ etu esiri kenye ngalaba dị icheiche ego.
2018-05-17T15:07:03Z
Bọjetị Naịjirịa nke 2018 ọ ga-enyere ndị ntoroọbịa aka?
Ụlọomeiwu Sineti Buhari nyere ndị ụlọoimiwu Bojet afọ 2018 ọnwa isi gara aga. N'ụbọchị Tusde bụ Mee 15, Ụlọomeiwu nke Naịjirịa binyere aka n'akwụkwọ ga-achị mkpata na mmefụ nke akpọrọ Bọjeti 2018. Bọjeti a ha binyere aka kwuru na Naịjirịa ga-emefu naira 9.120,334,988,225, bụ ọnụ ego jiri njere naira 500 karia ego dị na akwụkwọ onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ya na mbụ. Onyeisiala nyere ha tari naira 8.612. Na ihe gosiri na gọọmentị kwusiri ike na okwu ya na ọ ga-etinye anya n'ọrụ banyere mmepe obodo ka ngalaba na-ahu maka ọkụ latrik, ọrụ na ụlọ (bụ nke akpọrọ Minsitry of Power, Works and Housing na asụsụ Bekee) bụ ndị nwetakarị ego mmefu na Bọjetị ka ha wetera Njeri naira 682 na mmanye. Nkwa asaa Buhari kwere na ihe o mere Agbalịkwaranụ m- Buhari Na otu aka ahụ, ngalaba na-ahụ maka njem nwetara njeri naira 251 na mmanye. Onyeisiala na ndị isi otu APC nwere sọsọ ọnwa ole na ole iji gosi ndị Naịjirịa ma eji ọganịrụ bịa Ndị ọzọ bụ ngalaba na-ahu maka nchekwa nwetara njeri 157 n'ọma; ngalaba na-ahụ maka ọrụ ugbo na mmepe ime oboso nwetara njeri 149 na mmanye; ngalaba na-ahụ maka mmiri nwetara njeri naira 147 n'ọma; ngalaba na-ahụ maka azụmahịa nwetara njeri naira 105 n'ọma. Ndị nọ na okpuru bụ ngalaba na-ahụ maka akwụkwụọ na nke ahuike. Ngalaba akwụkwọ nwetara njeri naira 102 n'ọma ka Ahuike nwetara njeri naira 86 na ọma. Ngala na-ahụ maka ihe banyere Naịja Delta nwetara njeri 58,082,611,977 ka nke na-ahụ maka gbụrụgbụru nwetara mpekatampe n'ime ha niile. Ha nwetara njeri naira 17 n'ọma. Ngalaba na-ahụ maka ọrụ, ọkụ na ụlọ bu ndị nwetara ego karịa na Bọjetị 2018 Na ihe ọzọ gosiri na gọọmentị tinyere uche na ọrụ mmepe bu etụ ha sị nye ngalaba ha kpọrọ "special intervention programme" njeri naira 150, nye nke ha kpọrọ "grants and donor funded projects" njeri naira 169 na ọma, na nke ha kpọrọ "zonal intervention projects" nwetara njere naira 100. Ihe ndi ntoroọbịa Ndi ntoroọbịa ga-erite oru na ọrụ nwereike ipụta n'ego etinyere na ngalaba na-ahu maka ọrụ. Oru a ha ga-erite bu site na ọru ha ga-enweta ma ọru ụzọ na ọrụ ihiwe ụlo bido n'ike. Cheta na Pati na-achị bụ APC kwere nkwa na ha ga-ekepụta ọrụ nde atọ ma ha banye n'ọkwa mgbe ha na-achọ ka ebinyere ya aka n'afọ 2015. Babatunde Fashola bu Minista na-ahụ maka ngala gọọmentị aka ha di ọrụ Ka a na-akwado ntụlị aka 2019, gọọmentị Buhari ga-achọ ka ha mezuo nkwa ha kwere , nke ga-eme ka ha hu na ọrụ dị icheiche ha ji n'aka bụrụ ihe arụchara tupu ntụlị aka ebido. Akụkọ ga-amasị gị: Ọnụ ahịa ihe oriri agbadatala? Akụkọ na-eme ugbua: Ụlọikpe akagbuola nkwụsịọrụnike Omo-Agege Ụlọikpe atọhapụla Dino
[ "Naijiria", "Ahịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44156522
Ihe ndị "Restoration Group" kwuru maka Okorocha
Ndị "Restoration Group" kwuru na amanyere ha iwu ka ha rịọ Gọvanọ Rochas tupu agba ụlọ APC ọkụ.
2018-05-17T17:58:50Z
Ihe ndị "Restoration Group" kwuru maka Okorocha
Ndị "Restoration Group" kwuru na amanyere ha iwu ka ha rịọ Gọvanọ Rochas tupu agba ụlọ APC ọkụ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44156521
Ike agwụla ndị iro anyị-Sam Ọnwụemeodo
APC n'Imo steetị na-ekpo ọkụ ka ndị kpọrọ onwe ha "Restoration Group" kwuru na Rochas Okorocha adịghị amapụ ha obi.
2018-05-17T18:25:57Z
Anyi anaghi atu egwu Okorocha - ndị nkewa APC Imo
Esemokwu onye ga abụ onye ga-anọchịte anya ndị APC Imo dịka gọvanọ na ntụlịaka nke 2019 ka na-adakwa. Cheta na esemokwu a pụtara ihe n'ọnwa a, mgbe ha mere nhazi akpọrọ "Congress" a ga-eji họpụta onye ga-eji aha pati ahụ zọọ ọkwa gọvanọ. Taa, otu n'ime ndị kewapụtara n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC kpọrọ ndị ntaakụkọ n'isi ụlọọrụ ha maka ị kọwa echiche ha n'esomokwu nke di n'etiti ndị APC nke Imo steeti.N'ọnụ okwu TOE Ekechi bụ onụ na-ekwuchitere otu a, ha na-ebo gọvanọ Okorocha ebubo na o nupuru iwu ji patu ha isi ọtụtụ oge. Onye ga-abụ Gọvanọ Imo Steet na 2019? Okorocha ọ pụrụ imeli ọgọ ya Gọvanọ Imo steeti? A nwụchiela mmadụ anọ maka izu akwụkwọ ntuliaka APC Ekechi kwuru na "Okorocha eriela ego niile dị n'Imo steeti, ndị Igbo na APC ajụla Okorocha n'Imo"Ọ gakwara n'ihu na-ebo Okorocha ndị omeiwu nke Imo steeti ebubo na ha anaghị arụ ọrụ ọbụla n'Imo steeti. Ekechi kwuru na ha nwere ihe onyonyo ruru 40 ga-abụ ihe ga-akwụ dịka ihe akaebe ha na ntuliaka "Congress" mere n'Imo steeti. Ndị "Restoration Group" si na ha ga alaghachị Imo maka ntụlịaka Ha kwukwara na Okorocha a na-abataghị ntuliaka emere n'Imo steeti maka na ọ na-agba mbọ ihụ na ọgọ ya nwoke were ọchịchị gọvanọ n'afọ 2019. Otu a na-ekwu kwa na Okorocha ekwughi eziokwu mgbe ọkpọro ndị mmadụ aha na ha esoghi na pati. BBC Igbo jụrụ onye ode akwụkwọ Gọvanọ Okorocha bụ Sam Onwuemeodo ihe ochere banyere n'ihe niile ndị "Restoration Group" na-ekwu mana ọ gwara anyị na-onweghị ihe ọ ga-ekwu banyere ha maka n'uche ya, ha emechala ihe ha nwereike ime. "Ike agwụla ha," Onwuemeodo gwara anyị.Ekechi na ndị otu ya kwuru na ha ga-abata Imo steeti maka ntụlịaka ga-eme echi bụ ụbọchi iri na asatọ nke ọnwa Mee. Akụkọ ga-amasị gị: Ụlọọgwụ Ọrthọpedic Enugwu dị ka ebe agbara ọsọ agha Bọjetị 2018 ọ ga-enyere ndị ntoroọbịa aka? Gọọmenti etiti ọ na-ahọrọ mkpebi ụlọikpe?
[ "Naijiria", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44193675
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: NFF akwụbeghị ndị Super Eagles ụgwọ
Nyesom Wike kwuru na ndụ ya nọ na iyi egwu ebe ọ na-atụ gọọmenti etiti aka,NFF akwụbeghị ndị Super Eagles ụgwọ nakwa mbọ a na-agba ijide Ebola na Congo.
2018-05-21T07:07:18Z
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: NFF akwụbeghị ndị Super Eagles ụgwọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Ndị IPOB na-achọ inye ndị Ohaneze ọsọ n'ọgbakọ Ohaneze na-akwado ime. Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017 Dịka a na-ele anya maka ọgbakọ ndị Ọhaneze chọrọ ime maka ịhazigharị obodo, ndị IPOB ekwuola na ha ga-me ọchụ ebe ahụ ma onye ndu ala Igbo ọbụla gaa ya bụ ọgbakọ. Naịjirịa Nyesom Wike na gọọmentị etiti na-akọrịta ọnụ nke ọhụrụ a. Aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike etiela mkpu na gọọmenti etiti chọrọ igbu ya. Gọọmentị etiti chọrọ igbu m - Wike Akụkọ kachasị n'abalị a: Ọrụ agaghị akwụsị n'akwa Niger nke abụọ Mana ụlọọrụ onyeisiala kwuru na ebubo anụrụma codeine na-ebute na-efegharị ebe niile nke na-ekwesighi nzaghachi. Ebe ọzọ na Naịjirịa Gọọmenti etiti na-ekwu ka ụmụ Naịjirịa ghara iweghachite ndị PDP Na aka nke ọzọ, ụlọorụ onyeisiala ekwuola na ụmụ Naịjirịa nwaa anwa weghachite ndị PDP n'ọchịchị, ị mara na ego niile PDP zuru a natara ha ga-alaghachikwurukwa ha ọzọ. Akụkọ mba ofesi A na-agba mbọ ijide ebola n'ime DR Congo sọọsọ. Ebola bịara na Naịjirịa na 2014 mana gọọmenti Naịjirịa jidere ya nkeọma Ndị na-chọ ịkwụsị ọrịa Ebola na Congo ebidola inye ọgwụ mgbochi a ka na-enyocha enyocha. Ndị ọrụ ahụike ga-ebu ụzọ nara ya bụ ọgwụ. N'egwuregwu, NFF akwụbeghi ndị Super Eagles ụgwọ mana ha ga-akwụ na nso a. Dịka asọmpi iko mbaụwa na-abịa, ndị NFF ekwuola na ha ga-akwụ ndị Super Eagles ụgwọ ha n'oge na-adịghị anya. Super ga-agbakwa otu Athletico Madrid n'Uyo echi n'asọmpi enyi na enyi iji kwado maka asọmpi iko mbaụwa ahụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa:
[ "Mmkpamkpa Ebola", "Democratic Republic of Congo", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Iko mba uwa FIFA 2018", "All Progressives Congress", "Riva steeti", "Iko mba ụwa", "PDP (People's Democratic Party)" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44206876
Anyi achọghị Buhari na Atiku - Otu ugwu hausa
Otu kwuburu ka ndị igbo bi n'ugwu hausa kwaralawa ekwuola na ha chọghị Buhari ma ọ bụ Atika dịka onyeisiala.
2018-05-22T06:07:33Z
Anyi achọghị Buhari na Atiku - Otu ugwu hausa
Mohamadu Buhari Muhamadu Buhari agaala ụlọogwụ ugboro ole na ole maka nleta onwe ya Otu kporo onweha 'The Coalition of Northern Groups' na bekee gwara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhuri na onye chiburu dịka osote onyeisiala n'oge garaaga bụ Atiku Abubakar na ọ ga-adị mma maọbụrụ na ha abụọ wepuru aka n'ime ọsọ ị banye n'ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala n'afọ 2019. Otu a kwuru na ha na-ekwusi okwu ike makana ha abụọ bụ Buhari na Atiku karịrị afọ iri asaa na kwa na ndị ntorobia kwesiri ị bụ ndị ga-achị Naịjirịa ugbua na kwa n'iru. 2019: 'Ndị Igbo akwadoghị Buhari' Atiku etinyela ụkwụ na ndọrọndọrọ 2019 Ha kwukwara na ọ bụ ndị chiburu Naịjiria n'oge garaaga burukwa ndị ka goro nka bụ ndị mebiri Naịjirịa, na kwa oge eruola ndị ntorobia buru Naịjirịa gawa ala ekwere nkwa. Otu ha kwuru okwu a n'ime akwụkwọ a dere na ngwụcha ọgbakọ ha na Kaduna n'ụbọchị Monde. Atiku Abubakar anwaala ugboro ole na ole ị bụ onyeisiala Naijiria Cheta n'ọbụ ndị otu a sị ka ndị Igbo bị na mpaghara ugwu hausa kwara lawa. Mana ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Garba Shehu azaala otu a. Shehu kwuru na onweghị iwu ọbụla na Naịjirịa kwuru na onye karịrị afọ iri asaa anaghị enwe ike ị so n'ọsọ ịzọ ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala Naịjirịa. Onweghị ihe Atiku Abubakar kwuru ugbua maka okwu a otu nke a na-ekwu. Otu a kwukwara na ihe kachasị dị ha mkpa bụ ka gọọmentị leba anya na ntụlịaka maka ị nwere onwe nke a kpọrọ 'referendum' na bekee. Olisa Metuh adala n'ụlọikpe Ndị uweojii achụsasịala ndị Ipob n'Awka
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44212366
A nwụchiela nwa mahadum ji egbe ga ohi
Ndị uweojii nọ na Legos nwụchiri ụmụaka na-eto eto abụọ maka iji egbe ezu ohi.
2018-05-22T12:13:44Z
A nwụchiela nwa mahadum ji egbe ga ohi
Gideon na Afeez Gideon bụ nwa onye ndọrọndọrọ ọchíchí Ndị uweojii nọ na Legos anwụchiela Gideon Bamidele, 19, nwa mahadum (Caleb University),na enyi ya bụ Afeez Anifowoshe, 20,maka iji egbe ezu ohi. Gideon, onye nọ afọ nke atọ dịka onye na-agụ Kọmputa Sayensi na mahadum ahụ na enyi ya ji egbe ụmụaka chọrọ ịnapụ a kpọrọ Olugbenga Otun, onye ọkwọụgbọala Uber ụgbọala ya oge nkata gbudoro ha. Ohi Kwara: Ndị uweojii anwụchiela mmadụ 7 Ndị ohi ejirila aka ha gaa mkpọrọ Otu nwoke egbuola nwunye ya n'Enugwu Ma oge ha rutere nso ebe a kpọrọ Itowolo Bridge, Gideon wepụtara egbe ụmụaka chọrọ ịnapụ ọkwọụgbọala ƴa. Ọ bụ ka ha na nwoke ahụ na-agbarita ka ha nwere ihe mberede mere ka ụgbọala ahụ ṣọgharịa. Onye ọkwọụgbọala ahụ tiri mkpu enyemaka nke kpọkọbara ndị mmadụ nke gụnyere ndị uweojii. Oge onye ntaakụkọ BBC gbara Gideon ajụjụ ọnụ ihe tinyere ya n' izu ohi, o kwuru na ọ bụ ajọ enyi nakwa ịnụ anwụrụike. Gideon Bamidele na Afeez Anifowoshe chọrọ ịnapụ onye Uber ụgbọala Toyota Corolla ya Gideon, onye bụ nwa otu onye ndọrọndọrọvchịchị a maara ama na mpaghara Surulere (nke a chọghị ịkpọ aha ya) kwuru n'anya mmiri sị: "Amaghị m ihe banyere m n'ime mere ka m banye na Shoprite zụrụ egbe ụmụaka ụbọchị ụka ma gwa nwata nwoke imara ka anyị were ya rụọ ọrụ." Onyeisi ndị uweojii na Legos bụ Imohimin Edgal kọwara na ndị uweojii na- eme nyocha n'okwu ahụ. Na ha ga-akpụpụ ha ụlọikpe ma ha mecha nchọpụta ha. Akụkọ ga-amasị: Ndị ụka katọlik n'Enugwu na-esonye na ngagharị iwe taa IPOB bu ọgbaghara bịa n'ọgbakọ Ndigbo n'Awka Anyi achọghị Buhari na Atiku - Otu ugwu hausa
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44200154
Ọnọdụ Ndigbo adịghị mma - Bob Manuel
Onye ama ama n'ihe nkiri na Naịjirịa bụ Bobmanuel Odogwu ekwuola uche ya gbasara ọnọdụ ndị Igbo n'ala Naịjirịa.
2018-05-22T14:08:04Z
Bob manuel: A na-akpagbu ndị Igbo na Naịjirịa
Nwafọ Igbo ama ama n'ime ihe nkiri Nollywood bụ Bobmanuel Odogwu kwuru na ọnọdụ ndị Igbo na Naịjirịa bụ ihe nwute. O kwuru nke a mgbe ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'Enugwu. Odogwu kwuru na ndị Igbo bụ ndị mbụ na Naịjirịa, mana e bidoro na akpagbu ha ma kpagide ha n'akụkụ. O kwuru na mgbe a lụchara agha Biafra, na a naara ndị Igbo ihe niile ha nwere. Mana n'ime afọ iri anọ, ndị Igbo wee pultekwa dịka osiisi achara ma soro n'ihe niile a na-eme na Naịjirịa. Odogwu gara n'ihụ rịọ ndị Igbo ka ha nwee otu obi ma pụta n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, i ji were ezi ọnọdụ ruru ha.
[ "Nollywood", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44213490
Ngagharịiwe ndị Katọlik: Ka o si ga
Ndị Katọlik na Naijiria niile mere ngagharịiwe iji gosi obi mwute ha maka oke ogbugbu mmadụ na-aga na Naịjirịa.
2018-05-22T17:49:35Z
Ngagharịiwe ndị Katọlik: Ka o si ga
Ndị ụka Katọlik Igwurube mmadụ pụtara na kadụna maka ngagharịiwe ahụ na steeti dị iche iche na Naịjirịa Ndị Katọlik na Naijiria niile mere ngagharịiwe iji gosi obi mwute ha maka oke ogbugbu mmadụ na-aga na Naijiria. N' ọnwa Epreelụ, ndị e chere na ha bụ ndị Fulani ọchịehi gburu ndị ụkọchukuw abụọ na ndị ụka Katọlik iri na asaa ndị Fulani ọchịehi gburu na Benue. Ọgbakọ ndị Bishọp gwara ndị ha na-achịkọta ka ha mee ngagharịiwe taa dịka a na-eme emume akwamozu ndị ahụ nwụrụ taa bụ Tuusde na Benue. N' okwu ya oge o du ndị ụka kaolik na ngagharịiwe, Bishọp ụka Katolik na Port-Harcourt bụ Camilus Etokudoh kwuru oke mkpa ndụ mmadụ dị ma katọọ oke igbu mmadụ. O kwuru na ngariiwe ahụ abụghị maka okwu ndọọndọrọ ọchịchị. "Ndị ọchịehi ewegharala ọtụtụ ala anyị dịka anyị gara n'ihu na edegara onyeisiala Buhari akwụkwọ maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa." Ndị Katọlik na Kadụna bucha ozi na-ekwu ka gọọmenti kwụsị oke ogbugbu mmadụ N'Enugwu, ndị nne, nna, ụmụaka na ndị chiri echiche n'ụka pụtara n'igwe maka ngagharịiwe. Ndị e chiri echi na Katolik sonyere na ngagharịiwe e mere n'Enugwu Akụkọ ndị ga-amasi gi: Ndị ọgba bọọlụ na Yorupe na-enyeghi goolu ọbụla n'afọ a IPOB bu ọgbaghara bịa n'ọgbakọ Ndigbo n'Awka Ndị ụka katọlik n'Enugwu na-esonye na ngagharị iwe taa
[ "Kaduna", "Legọsị", "Naijiria", "Enugu Steeti", "Port Harcourt" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-44237556
'Mụ na Prince William bụ enyi'
Ebuka Obi-Uchendu na-akọwa ihe mere aha ya jiri wuo na Twitter n'ụbọchị agbamakwụkwọ Harry na Meghan.
2018-05-24T09:00:37Z
Ebuka: Mụ na Prince William bụ enyi
Ebuka Obi-Uchendu bụ onye na-eme ihe onyonyo amaama, gwara BBC Igbo ihe mere o jiri wuo ewu n'ụbọchị agbamakwụkwọ Harry na Meghan. Ọrụ si n'aka: Jessica Nwankwo
[ "Nollywood", "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-44271446
Lee ihe kachasị ụmụaka Naịjirịa mkpa ugbu a
Ụmụaka Naịjirịa ekwuola ihe ha chọrọ ka gọọmentị etiti mere ha dịka a na-eme emume ụbọchị ncheta ha.
2018-05-27T10:18:16Z
Lee ihe kachasị ụmụaka Naịjirịa mkpa ugbu a
Ọnwa Mee 27 n'afọ ọbụla bụ ụbọchị pụrụiche ekewapụtara maka ncheta ụmụaka niile nọ na Naịjirịa na ihe gbasara ha. Dika a na-eme emume ụbọchị ncheta ha nke afọ 2018, ụmụaka Naịjirịa ekwuola ihe ha chọrọ ka gọọmentị etiti mere ha. Gọọmentị etiti nakwa ngalaba na-ahụ maka ụmụaka na mbaụwa niile akpọrọ UNICEF ekwuola na ha ga-eme ihe niile ike ha ruru iji wee kwụsị mwakpo ụmụaka .
[ "Naijiria", "Ịwakpo mmadu na-ike", "Ụmụaka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44270428
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ụmụaka bụ olileanya Naịjirịa - Buhari
'Biafra Zionists Federation' akachapụla iwu ị nọ n'ụlọ Ipob na MASSOB na akụkọ ndị ọzọ.
2018-05-27T10:29:13Z
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Biafra Zionists Federation na Ipob na-ama aka
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Ụmụaka bụ Olileanya Naịjirịa - Buhari Dịka taa bụ ụbọchị ncheta ụmụaka na Naịjirịa, Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola ndị ọrụ nchekwa, ezinaụlọ, ndị isi obodo nakwa nke okpukperechi ka ha bilie buo agha megide mwakpo ụmụaka bụ nke na-arị elu. Buhari kwuru na ụmụaka bụ ọdịnihu Naịjirịa, na-atụmatụ si n'aka ha na-enye ya owuweanya na Naịjirịa nwere ndịnihu dị mma. Biafra Zionists Federation akachapụla iwu ị nọ n'ụlọ Ipob na MASSOB Dịka Ipob na MASSOB enyela iwu ka ndị mmadụ nọọrọ n'ụlọ n'abalị iri atọ nke ọnwa Mee, iji cheta ndị Biafra nwụrụ na-agha Otu kpọrọ onwe ha Biafra Zionists Federation kachapụrụ iwe a ma gwa ndị mmadụ ka buru ọkọlọtọ Biafra gawa n'Enugwu iji kwupụta mwereonwe Biafra. Akụkọ kachasị n'abalị a: Ipob si Igbo apụla na 30 Mee IPOB bu ọgbaghara bịa n'ọgbakọ Ndigbo n'Awka 'Ipob mezuru ebumobi ikposaa ọgbakọ Ohaneze' Akụkọ mba ofesi; Saụt Korịa agbarala Not Koria akaebe Onyeisiala mba Saụt Korịa bụ Moon Jae-in ekwuola na ogbo ya nke Nọt Korịa bụ Kim Jong-in chọrọ ịkpọchapụ ngwaagha nuklịa n'ogige Korịa peninsula. Moon Jae-in kwuru na ọ maghị ma mba US ọ ga-ekwenye na mkpebi a, kama ka ha nụrụ ya site n'ọnụ Kim. Trump akagbuola mkparịtaụka ya na Kim Udo ọ ga-abia n'etiti North na South Korea? N'egwuregwu; Akwa dara n'ọgbọ egwuregwu dị na Kiev n'abalị mgbeReal Madrid jiri goolu ato asatara otu merie Liverpool n'agba ikpeazụ asọmpi Uefa Champịọns Mmeri a ga-eme ya ugboro atọ n'ụsoro ma bụrụ ugboro iri na atọ n'oge niile Real Madrid na-amabute iko a. Ihe a na-ekwu maka Champịọns League nke abalị a Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa:
[ "Real Madrid", "Naijiria", "North Korea", "Ndịda Korea", "Liverpool F.C.", "Ụmụaka", "Bọọlụ", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44274364
Akụkọ kachasị n'abalị a: Salah ọ ga-aga iko mbaụwa?
Mohamed Salah meruru ezigbo ahụ n'asọmpi liverpool na Real Madrid ụnyaahụ ebe Real Madrid ji ọkpụ atọ merie ha were buru iko nke lig.
2018-05-27T19:43:33Z
Akụkọ kachasị n'abalị a: Salah ọ ga-aga iko mbaụwa?
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Mo Salah tụnyere aka ya na-mmeri emeriri ha ụnyahụ Ị ma na Iko mbaụwa afọ a nwere ike ịcha Mohammed Salah? Onye nlekọta otu egwu bọọlụ Liverpool bụ Jurgen Klopp ekwuola na mmerụ ahụ Mohamed Salah nwere abụghị obere ihe, na ọ dịka ọgbajiri ọkpụkpụ olu ma ọ bụ nku aka. Ndị uweojii adọọla aka na ntị maka ogbunigwe dị n'ala Ebere Amaraizu bụ ọnụ n'ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti Ndị uweojii akpọkuola ndị ọrụugbo na ndị ọrụụzọ ka ha saa anya miri maka ogbunigwe e liri n'ala oge agha. Ebere Amaraizu bụ ọnụ n'ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti kpọrọ oku a na mkparita ụka ya na BBC Igbo nwere taa. Kpọghachite ndị uweojii - Ibrahim Idris Unu ekwela ka ihe mere anya mee imi Massob achọghị uweojii nke steeti Onyeisiala Buharị ekwela ụmụaka nkwa taa bụ ụbọchị ha Buharí nyere iwu ka ndí nchekwa na ezinaụlọ lebere ụmụaka anya n'ụzọ pụrụ iche Dịka taa bụ ụbọchị ncheta ụmụaka n'ụwa nịịle gbaa gburugburu, onyeisiala Buharị akpọkụola ndị nkuzi, ezinaụlọ nakwa ndị ọrụ nchekwa obodo ka ha do do do hụ na ụmụaka nwere ezi nchekwa na Naịjirịa. Onyeisiala kpọrọ okụ a n'ozi ya ebe oha na eze turu anya na ọ ga ekwute maka ụmụaka Chibok fọrọ na Leah Sharibu ka na-efu efu. Akụkọ mba ofesi; Amụma mmiri akwụsịla ndị ụgbọelụ na Britain Ihe dịka amụma mmiri ruru 15,000 sere n'igwe na ọdịda anyanwụ Briten ụnyahụ Oke egbe igwe gbara na Britain unyaahụ emela ka ụgbọelụ ndị kwadoro ime njem taa kwusị njem ha n'ọdọ ụgbọelụ Stansted. Ya bụ egbeigwe tinyekwara okụ n'ebe ụfọdụ nke a sị na ndị na-achụ ọkụ gbanyuru n'isi ụtụtụ taa. Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa:
[ "United Kingdom", "Egwuruegwu", "Enugu Steeti", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Ụmụaka", "Muhammadu Buhari", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44272704
Lee etu ndị mmadụ si cheta ụmụaka taa
Ọtụtụ mmadụ chetara ụmụaka n'ụzọ dị iche iche taa ka ụwa niile na-eme mmemme ncheta ụmụaka.
2018-05-27T19:50:03Z
Lee etu ndị mmadụ si cheta ụmụaka taa
Nwaakwụkwọ Ụmụaka bụ ọdịnaihu Naịjirịa mana ndị mmadụ na-ekwu na ha anaghị enweta ezi nkuzi n'ụdị nkuzi dị na Naịjirịa ugbua Onyeisiala BUhari ji akwụkwọ ozi o zigara ụmụaka taa wee bido ya bụ mmemme ebe ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu gakwara sonyere ụmụaka taa, tụmadị ụmụaka ndị nọ n'ahụhụ dị icheiche. Ụfọdụ gara ebe ndị agha Boko Haram chụsasịrị bi ebe ụfọdụ gara ebe ndị ọzọ dị icheiche. Amalu Ngozi gosiri etu ya bụ mmemme si gaa n'ọgbọ egwuregwu dị n'Enugwu taa. Ihe 8 onyeisala Buhari kwuru maka ụmụaka taa Buhari: Buo agha megide mwakpo ụmụaka Nke a bụ foto ụlọọrụ onyeisiala zipuru igosi etu o si echeta ụmụaka, ha zipuru n'igwe twitter; N'akụkụ nke ya, onyeisi ndị ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki kwuru na ya gara ebe ogige ebe ndị oyiegwu chụsasịrị bi na Benue steeti, O kwuru na ụmụaka enweghi ihe ha mere ha jiri nọrọ ebe ahụ mana ha bụ ọdịnaihu ala Naịjirịa. N'aka nke ọzọ onye bụbu osote onyeisiala bụ Atiku Abubakar nọrọ n'akara twitter ya kwuo ka e cheta ụmụaka ma nọnyere ha, mee ka ha chịa ọchị. Onye meriri ihe nkiri BBN nke afọ 2018 bụ Miracle Ikechukwu ekpeghikwa azụ ebe o dekwara ozi nke ya ma ga nọnyere ụfọdụ ụmụaka ma kwuo na olileanya anyị ga-abalị na mmezu ma e soo ha nke ọma. Oluyemi Fasipe dere ozi nke ya ma kwuo na ya na-echetara ụmụ Naịjirịa niile na ndị mba ofesi maka Leah Sharibu bụ onye ndị Boko Haram kpọrọ ma na ha akpọghachitebeghi ya. O kwuru na ụmụaka ndị ọzọ na nne na nna ha nọ mana nwantakịrị nwaanyị a na ndị mụrụ ya anọghị, ka a ghara ichefu ya. Deekachy dere akụkọ na-agbawa obi gbasara nwantakịrị nwaanyị dị afọ 9 dị ime nke o kwuru na ya hụrụ ebe ọ chọrọ ịmụ nwa. Ọ kọwara na ọ lụrụ di n'afọ asatọ wee na-ekele ụmụaka niile ndị dị etu ahụ. Osinachi ji ọchị na-eme nke ya ebe ọ na-ekele onye ọbụla rugoro afọ 20 mana na-anata ndị mụrụ ya ego dịka nwantakịrị. Lee ihe ụmụaka chọrọ ka e mere ha taa bụ ụbọchị ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Akụkọ kachasi : Ipob nabatara Buhari 2019 'Ndigbo ga-ajụ Buhari ọzọ' Ndị Benue apụtaghị nabata Buhari
[ "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Ụmụaka" ]
https://www.bbc.com/igbo/44279020
Onye Mali rigoro ụlọelu ịzọ nwata abụrụla onye France
Onyeisiala France bụ Emmanuel Macron enyela Maazi Gassama akwụkwọ ikike iji bụru onye mba France.
2018-05-28T13:57:26Z
Onye Mali rigoro ụlọelu ịzọ nwata abụrụla onye France
Gassama na Macron Gassama na Macron zụkọrọ taa Otu onye Mali gbagara ọsọ ndụ na France abụrụla onye a na-akpọ dike maka etu o siri gba mbọ zọpụta nwata dị afọ anọ chọbụrụ ị dapụ n'elu ụlọelu. N'otu aka ahụ kwa, onyeisiala France bụ Emmanuel Macron emela nwoke ahụ a kpọrọ Mamoudu Gassama onye France, ma nye ya akwụkwọ ikike. Mamoudou Gassama nwetara ekele nke ukwuu etu o siri ria ilu uloelu ahụ ga zopụta nwata ahu chọrọ ị dapụ. France: Otu onye uweojii anwụọla Mmadụ 16 emerụọla ahụ na France Onyonmyo siri France gosiri ebe ọ na arị ụlọ elu ahụ nakwa ndị mmadụ na-eti mkpu ha ji agba ya ume. Ka onyeisiala Emmanuel Macron zutere ya n'obi ukwu ndị France akpọrọ Elysee Palace, okwuru na Gassam ga abụrụzi onye France. Ọ gakwara n'ihu nye Gassama ezigbo ekele, ma nye ya ọlaedo ma kwukwa na a ga enye ya ọrụ n'ụlọ ịgbanyụ ọkụ. Oku mberede a Gassama zara mere n'isi obodo France bụ Paris, n'ehihe ụbọchị 27 ọnwa a bụ Mee. Gassam zikọrọ akwụkị̀ọ ikike enyere ya Maazi Gassama kwuru na ọ na-agafe were hụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ihu ụlọ ahụ. "Ka m kutere nwa ahụ n'aka m, ajụrụ m ya ihe mere o jiri me ihe a omere, mana ọ zaghị m," Gassama kwuru. Ndị ọlụ mgbanyụ ọkụ Paris kwuru na mgbe ha rụrụ ebeahụ, ha hụrụ na a zọpụtara onye nọ na nsogbu. Akụkọ Maazị Gassama dị ka ihe onye Mali ọzọ a kpọrọ Lassana Bathily mere n'afọ 2015 mgbe ndị oyi egwu wakporo ebe a na-ere nrị. Maazi Bathily nyere mmadụ isii aka di ka ọ kpọrọ ha gaa ebe ha zoro ma rịpụ ga kpọ ndị uweojii. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Enugwu ga-abụ obodo kacha ọcha - Ugwuanyi Lai Mohammed: Buhari emeela ọfụma Ihe 8 onyeisala Buhari kwuru maka ụmụaka taa
[ "France", "Njepụ", "Mmeru nwata" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44328328
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Serena awakela ọzọ
Agbara nwanayị tenis bụ Serena Williams awakela ka anyanwụ ọzo.
2018-06-01T08:42:58Z
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Serena Williams awakela ọzọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Serena Williams awakela ka anyanwụ ọzọ Serena gbara dị afọ 36 nọzi na agba nke atọ na French opun Agbara nwaanyị na egwuruegwu tennis bụ Serena Williams sị ụwa chere aka ghọrọ ya na ọdịnihụ. Serena bụ onye meriri Ashleigh Barty nke mba Australia sị na ya ga-emecha sịe ike karịa ka ya dị bụ tupu ya amụọ nwa bụ nke sechituru ya nwaazụ na-egwu. Rochas anọghị n'ọgbakọ APC Owelle Rochas bụ Gọvanọ Imo Steeti Achọrọ Owelle Rochas achọ na ọgbakọ ndị APC n'Abụja ụnyahụ ebe ọtụtụ ndị isi ọzọ ndị pati ahụ zuru na ya bụ ọgbakọ Owelle sị na ya bụ ọgbakọ ezughi oke ma ya bụ onyeisi pati ahụ na ọwụwa anyanwụ a nọghị ya. Cheta na Rochas na ndị pati ya malitere ịnwe ọgbaghara nsonso a. Boko Haram agbuola ndịagha ise na Boronu Ndị agha ka na-ebuso Boko Haram agha n'ala Naịjiria Na Boronu steeti unyahụ, ndị Boko Haram wakporo ma ta isi ndị agha Naịjirịa ise. Texas Chukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa kwuputara nke a mgbe ọ sị na ndị omekaome a basara ndị agha operation Lafia dole ọgụ mgbe ihe a mere. Okorocha esoghi na nzụko ndị isi APC mere Ndịagha Naịjirịa anwụchiela gwogworo ato bụ mgbọ Ebumnobi ndị mmadụ gbasara ncheta Biafra Nkatọ esochiela mbuli ụtụisi ngwa ahịa igwe Trump Onyeisiala Donld Trump Nkatọ esochiele ụtụisi nke onyeisiala Trump nke Amerịka tinyere na-azụm ahịa igwe ndị mba ọzọ. Trump weliri ụtụisi ngwa ahịa na-aka mba EU, Canada na Mexico bụ ndị fooro ntutu ta na ha ga abọrọ mbọ. Gee nkeji ụtụtụ tata: Ihe nkiri nke taa:
[ "Boko Haram", "Egwuruegwu", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Donald Trump" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44327247
Okorocha esoghi na nzụko ndị isi APC mere
Aka na-achị Imo steeti ekwuola na nzụkọ ọbụla aka ya adịghị ya abụghị nke ọma ka ndị ọnụ na eru n'ọkụ n'APC gbakọrọ n'Abuja.
2018-06-01T11:13:30Z
Okorocha esoghi na nzụko ndị isi APC mere n'Abuja
Owele Rochas Okorocha Ka ndị so n'otu pati All Progressives Congress (APC) nke ọwụwa anyanwụ na-agbakọ n'Abuja na atụmatụ ha kpọrọ "South East Zonal Executive Committe" na asụsụ Bekee, bụ nke ha si bụ iji hazie etu ha ga-eji mee ọgbakọ ukwuu nke pati ha, onye na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha kwuru na aka ya adịghi na ya. Okorocha, dika ọ bụ sosọ ya bụ gọvanọ ndi APC nwere n'ala Igbo bụ onye a na-ahụ ka onyeisi APC n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, sị na ya bụ ọgbakọ ezughi oke ma ya anọghị ya. BBC Igbo Live: Ahịa tọgbọrọ chakoo iji cheta Biafra Imo Steeti agaghị amaputa ala ọbụla maka ndị na achị ehị Onye gbapere nzukọ a bụ osote onyeisi APC n'ala Igbo bụ Emma Eneuwku, bu onye kwuru na oge Igbo bụ ndị kewara ekewa agala. Ndị gara nzukọ a gunyere Ken Nnamani, Jim Nwobodo, Orji Kalu, Sullivan Chime, Martins Elechi, Ben Uwajimogu na ndị ọzọ. Ọnụ na-ekwụchịtere Ọkorocha bụ Sam Onwuemeodo kwuru: Ọbụrụ n'Okorocha nọ na nzụkọ ahu, mara na ọ bụ nke ziri ezi. Mana agaghi enwe nzụkọ ndị nwe APC na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ma ya bụru na ya bụ onyeisi Pati n'ebe ahu anọghị ya. Nke a pụtara na ọ bụ oge ka ha na-egbụ." Cheta na Okorocha na ufọdụ ndị APC na steeti ya na-enwe nsogbu maka ọ chọrọ ka ọgọ ya nwoke banye dị ka aka na-achi Imo steeti ma ya rituo. Ihe nkiri a na-egosi ihe onye okpa ọchị Uche Ogbuagu kwuru maka njem ya n'ọchịchị Rochas. Rochas ọ gara Daura ime gịnị ụnyaahụ? Ọkụ ụlọọrụ APC: Ọ bụ PDP mere ihe a - Onwuemeodo
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44327251
Uwe ndị Super Eagles bụzị 'ahịa iwu'
Uwe ndị Super Eagles eweputara n'ahịa tata agwụla n'ahịa nke gosiri na ndi mmadu hụrụ ya bụ uwe n'anya nke ukwuu.
2018-06-01T13:05:10Z
Uwe ndị Super Eagles bụzị 'ahịa iwu'
Akụkọ na-apụta na London na-egosi na ndị mmadụ kwụru n'ahịrị na London na-eche ka agape ụlọ ahịa ndị Nike makana ọ bụ tata ka ebidoro ire uwe ndị Super Eagles. Cheta na uwe a bụ nke ndi mmadụ kwuru na ha kacha hụ n'anya mgbe ewepụtara foto uwe ndi otu egwuregwu dị icheiche ji a ga iko mba ụwa na Rọshịa. Ndị mmadu na Twitter na-ekwu na ndị mmadụ na-eche ka ụlọ ahịa ndị Nike gbapere tata akwụrula n'ahịrị tupu chi efo. Nke mere ndị ụlọ ọrụ BBC na London jiri nọrụ n'ala ịgba ndi mmadụ ajụjụ ọnụ banyere okwu a. Na Twitter, @A01379 setere ihe ọhụrụ. @conroy_bumpus setere foto na-egosi ndị a kwụ n'ahiri. Onye ọrụ BBC Peter Okwoche na onwe ya setere ihe onyonyo gosiri ndị na-ahiri. @ogundamisi kwuru na ọ bụ sọsọ okwu uwe a ka a na-ekwu na ụlọ ọrụ ya. Ihe a niile mere ojighi tụọ n'anya mgbe ndị @DoubleEph edere na Twitter na ya bu uwe agwụla. Ndi niile na-eme ugbua abughị ihe mere na mberede. BBC Igbo jụbụrụ ajujụ maka uwe ndi Super Eagles a na-ahu na Naịjirịa ebe ndị mere ya ebidobeghi ire ya. Lee otu n'ime uwe nke adiboroja ndị mmadụ na intanet. Ụfọdụ ndị ahịa iwu ebidola ire uwe Naịjirịa na-echeghị ka ụlọọrụ Nike webata ya n'ahịa
[ "Egwuruegwu", "Omenala", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Bọọlụ", "Iko mba ụwa" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44339769
Super Eagles ga-eme nkeọma
Ụmụ afọ Naịjirịa bi na Lọndọn e gosila nkwado ha n'ebe ndị Super Eagles nọ ma kwuo na ha ga-eme nkeọma n'Iko Mba Uwa nke Rọshịa 2018.
2018-06-02T13:11:52Z
Super Eagles anaghị atụ onye ọbụla egwu
Onye ntaakụkọ BBC na Lọndọn bụ Peter Okwoche gbara ụmụ afọ Naịjirịa bị na Lọndọn ajụjụ maka ebumnobi ha n'ebe Super Eagles nọ. Ha kwuru na super Eagles ga-eme nkeọma n'asọmpi Iko Mba Ụwa nke Rọshịa 2018, na ha ga-eru agba anọ ma ọ bụ ọkara ikpeazụ. Ha gara n'ihu kwuo na onweghị otu bọọlụ ọbụla ndị Super Eagles na-atụ egwu. Onye ọzọ kwuru na ọ bụ mba Beljọm ka ọ na-atụ egwu n'asọmpi ahụ.
[ "London", "United Kingdom", "Naijiria", "Iko mba uwa FIFA 2018", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Bọọlụ", "Iko mba ụwa" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-44359637
French Open: Serena Williams apụọla
Agbara nwaanyị n'egwuregwu Tennis apụọla n'asọmpị 'French Open' maka mmerụ ahụ n'obi ya.
2018-06-04T14:38:03Z
French Open: Serena Williams apụọla
Serena Williams Williams kwụsịrị ịsọmpi n'ọnwa isii gara aga ịga mụọ nwa Ụlọ ntaakụkọ AP na-ekwu ugbua na agbara ewguregwu Tennis bụ Serena Williams apụọla na French Open. Ha kwuru Williams pụrụ na-egwurewgu ka ọ pụtara na o nwere asọmpị ya na Maria Sharapova ka ga-agba. Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Serena awakela ọzọ Serena na Venus Williams ga-asọmpi Lee ebe ndị AP gbasara akụkọ a n'elu akara soshal midia Twitter ha: Serena dị afọ ịrị atọ n'isii gwara ndị ntaakụkọ n'obodo Roland-Garros nke mba France taa n'ọbụ n'ihi ahụ ọ merụrụ n'obi ka o ji pụọ n'asọmpị ahụ. Serena na Maria Sharapova na-akwado ịgba asọmpị agba nke anọ taa bụ Mọnde. Lee ihe BBC Sport dere na Serena kwuru: Nke na-egosi na ọ bụ maka ezinaulo ha ka o jiri rapụ asọmpị a. Akụkọ ga-amasị gị E zuola Nwankwo Kanu ohi na Rọshịa Ụmụafọ Igbo ga-agba asọmpi Iko Mba Ụwa Ihe mere m ji tee mmanụ n'isi ndị mmadụ - Okorocha
[ "Egwuruegwu", "France" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44359285
Akụkọ kachasị n'abalị a: Volukeno egbuola ọtụtụ na Guatemala
Volukeno ahụ mere taa karịrị nke mere na mba ahụ kamgbe afọ otu narị gara aga.
2018-06-04T17:13:49Z
Akụkọ kachasị n'abalị a: Mmadụ 25 anwụọla site na volukeno na Guatemala
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa: Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a: Abụbọ ọrụ n'ụlọọrụ mịnịsịtrị sayensi na nka na ụzụ Some NLC members marched in Abuja in support of the strike Ndị ọrụ nọ na mịnịsịtrị sayensị na nka na ụzụ na ndị nkuzi na-arụ n'ụlọakwụkwọ na-eme nyocha awụsala ngwọ ọrụ ha n'abụbọ ọrụ. Ha kwụsịrị ọrụ na mịnịstrị ahụ na-ekwu ka e wepụ ode akwụkwọ ụlọakwụkwọ ndị ahụ bụ Shamaki. Naịjirịa Ego ụtụ ibubata mmanya ọkụ na anwụrụ etinyekwuola Naanị ndị rugoro afọ iri na asatọ kwesiri ịse anwụrụ na Naịjirịa Ndị niile na-ebubata mmanya ọkụ na anwụrụ bido taa ga-amalite ịkwụ ụgwọ ụtụ e ji ebubata ngwọahịa nye gọọmenti etiti. Gọọmenti etiti ga-amalite taa ịna ụgwọ ụtụ na ngwọahịa mmanya ọkụ na anwụrụ. Mmanya ọkụ, anwụrụ ga-ebido inwe ụtụ mbubata ọhụrụ taa Akụkọ mba ofesi Ọgbatauhie dakwasịrị mba Guatemala Fuego volcano has been spewing ash and smoke Ajọ ihe mberede volukeno mere na Guatemala taa egbuola mmadị iri abụọ na ise. Volukeno ahụ mere taa kachasị njọ na nke merela ebe ahụ kamgbe afọ otu narị. N'egwuregwu, E zuru Kanu Nwankwo ohi na Rọshịa taa ruru puku dọla iri na otu. E zuola Nwankwo Kanu ohi na Rọshịa Serena Williams esepụla aka n'asọmpi French Open tupu ọ ga-ezute Maria Sharapova Ndị mmadụ mmadụ na-ajụ ka ọ bụ ụjọ mere Serena jiri sepụ aka mana akụkọ kwuru na Serena nwere mmerụ ahụ. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji: Ihe nkiri nke taa:
[ "International Labour Organization", "Naijiria", "Ụmụaka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44395003
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Buhari agaghị atụpụrụ ndị omeiwu ọnụ - Garba Shehu
Onye enyemaka pụrụiche nye Buhari na mgbasa ozi bụ Garba Shehu ekwuola na ọ gaghị atụpụrụ ndị ụlọ omeiwu ọnụ maka egwu ha na-enye.
2018-06-07T08:33:12Z
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Buhari agaghị atụpụrụ ndị omeiwu ọnụ - Garba Shehu
Akụkọ kachasị mere taa; Buhari agaghị atụpụrụ ndị omeiwu ọnụ - Garba Shehu Onye enyemaka pụrụiche nke onyeisiala na mgbasa ozi bụ Garba Shehu ekwuola na onyeisiala aghaghị atụpụrụ ndị ụlọ omeiwu ọnụ na egwu ha na-eyi ịchutu ya n'ọrụ ma ọ bụrụ na ọ zaghị oku ha. O kwuru nke a mgbe ha mechara mkparịta ụka ndị isi ọchịchị ụnyaahụ. Ụlọomeiwu abụọ akpọọla Buhari oku Ihe ruru mmadụ iri na ise anwụọla na Benue Steeti Ihe ruru mmadụ iri na ise anwụọla na Benue Steeti site na mwakpo ndị a na-eche na ha bụ ndị ehi mere na mpaghara dị iche iche n'ime abalị abụọ. Kọmishịọna mgbasa ozi nke Steeti ahụ bụ Lawrence Onoja kwuru na na obodo ndị a gunyere Tsa Ishav, Yelwata na logo. Ọchị ehi na Benue: 'Aga m emezu iyi ọrụ m' - Buhari Kwụsịnu ichi ehi na-agagharị Onye bụbu ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Alfa Belgore ekwuola na iwu akwadoghị nkwanye ugwu nturugo Buhari nyere MKO Abiola. Cheta na Buhari kwanyere Abiola ugwu ma mee abalị iri na abụọ n'ọnwa juun ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo oche ya. Juun 12 bụ ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuucheya ọhụrụ N'egwuruegwu, Nyocha onye ntaakụkọ mba Ghana mere gbasara iri aka azụ ndị na-egbu bọọlụ gosiri otu onye na-egbu bọọlụ mba Kenya bụ Aden Range Marwa dịka ọ na-anata ego dị narị dọla isii n'aka otu bọọlụ dị na Ghana. FIFA ekwuola na nwa amadi a agaghị e so gbuo asọmpi iko mba ụwa na-abịa abịa. Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:Ihe nkiri nke taa: Lee ihe nkiri taa
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Kenya", "FIFA", "Iko mba uwa FIFA 2018", "Benue steeti", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]