source
stringlengths
0
47
title
stringlengths
0
100
description
stringlengths
0
502
date
stringlengths
0
20
headline
stringlengths
0
113
content
stringlengths
0
9.43k
tags
sequence
https://www.bbc.com/igbo/live/afirika-49233269
Sowore Revolution: Ka ekwe si akụ maka ngagharịiwe e ji maka ya nwụchie Sowore
BBC Igbo kwụ chịm iwetara gị ihe na-aga ka a na-ekwu okwu ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa.
[]
https://www.bbc.com/igbo/live/afirika-50013509
Ofala Festival: Ka mmemme Ofala sị aga n'Onitsha taa
Oge eruola ọzọ mgbe Obi na-achị Onitsha ga-apụta n'ebube ya.
[]
https://www.bbc.com/igbo/live/afirika-50078877
Onitsha tanker fire: Ndị ọkụ lara ihe ha n'iyi na-ekwu etu ọ dị ha
Obi nke Onitsha esonyela na ndị na-eti ndị ọkụ tanka a metụtara aka n'obi.
[]
https://www.bbc.com/igbo/43333555
Hilda Dokubọ kọwara ihe ise dị mkpa nne ọbụla kwesiri ịma
Hilda Dokubọ bụ onye na-eme ihe nkiri na-enye ndị nne ezigbo ndụmọdụ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/47375780
Presidential Election: A napụrụ ọtụtụ n'ọwụwa anyanwụ ohere itu vootu- Peter Obi
Peter Obi atụọla arịrị na usoro a gbasoro mee ntuliaka n'Ọwụwa anyanwụ dị iche na nke Ugwu- Awụsa.
[]
https://www.bbc.com/igbo/51462377
Ọgba mbọ: Ihe mere m ji ewe ụmụ nwaanyị n'ọrụ karịa ụmụnwoke
Ụkamaka Okoye kọwara BBC Igbo etu o siri bido n'iji akpakara igwe rụpụtawa ụzụ igwe nke ọgbatumtum ji arụ ọrụ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43237850
Onye okachamara n'ihe gbasara nchekwa
Onye okachamara n'ihe gbasara nchekwa
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43525072
'A ga-agbaghara ndị Boko Haram chegharịrịnụ'
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwela nkwa ịgbaghara ndị otu Boko Haram chegharịrịnụ.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ntọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43616137
Mama Boko Haram: Naịjirịa akwụghị ụgwọ ọbụla iji gbapụta ụmụ Dapchi
Na mkparịtaụka BBC Igbo na Mama Boko Haram nwere o kwuru na gọọmenti Naịjirịa akwụghị Boko Haram ego iji tọghapụ ụmụada Dapchi.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43783751
Obi adịghị Igbo mma ebe gọọmentị a dị
Sinetọ Abaribe gwara BBC Igbo na Igbo bụ Naịjirịa, mana adịghị enye ha oke ruru ha.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44584194
Onye FRSC suru ụgbọala ya enwetala ikpe ziri ezi
Otu nwoke aha ya bụ Festus Ijeomah na nwanne ya nwoke mere ngagharị iwe n'ụlọọrụ ndị Road Safety Commission dị n'Abuja.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45843801
"Anyị ga-edulata nna mụrụ Nnamdi Kanu" - Ikpeazu
Aka na-achị Imo steeti bụ Okezie Ikpeazu ekwuola na ya na ndị otu ya gọvanọ ndị ọzọ ga-akpọlata nna Nnamdi Kanu n'afọ a.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-46738350
Ahụghị ụzọ enweghị ihe o gbochiri - Di na nwunye kpuru isi
Ahụghị ụzọ enweghị ihe o gbochiri - Di na nwunye kpuru isi
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-46768840
Ndụmọdụ pụrụiche Charly Boy nyere ndị na-abanye alụmdinanwunye
Charly Boy si na alụmdinanwunye dị egwu, mana nsọpụrụ, iwe ya ka ọrụ bụ ihe kwesiri na ya bụ njem. Lee ndụmọdụ ndị ọzọ onyere ndị ndị nọ na ya bụ njem.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-47242609
Nnamdi Kanu: Ọ bụ Zik tinyere Igbo n'ụmị a
N'agba mkparịtaụka nke abụọ BBC Igbo na Nnamdi Kanu nwere, ọ kọwara na ọ gaghị eme mmehie Nnamdi Azikiwe mere n'oge nke ya.
[]
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-47779202
Rochas Okorocha kachiri ntị - Victor Umeh
Sịnetọ Victor Umeh nke APGA bụbu onyeotu Rochas Okorocha akụwala akụoyibo nsugbe maka Rochas na ọdịnihu ya na APC.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-47858756
Lee Alex Nwa-Ephraim Akwaiwu nwa afọ Igbo na-arụ ụgbọala
Lee Alex Nwa-Ephraim Akwaiwu nwa afọ Igbo na-arụ ụgbọala
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50266108
Electrical Engineering: 'Na nrọ ka e ziri m etu e si arụ igwe ọkụ latrik'
Nwa afọ Solomon Ukoha jị aka arụpụta ọnọchịrị igwe ọkụ sị na uche ya bụ na atụmatụ ọ na ewepụta ga-enyere ya aka ba ọgaranya n'ụwa a.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50387179
Social Media: I nwereike ịhapụ soshal midia n'otu ụbọchị?
N'izuụka a ụmụ ntorobia Igbo na-aza ajụjụ gbasara soshal midia na-agwa ha na-akpasa ya.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50445944
Fertility in marriage: Lee ka nwoke si asa ụmụ ejima atọ ya ahụ
Di na nwunye a gwara BBC Igbo ihe ndị ọzọ ha gabigara ka ha na-achọ nwa nakwa etu e si nabata ụmụ ha.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50746143
Indecent dressing: Kedụ onye ka eghewe ahụ oghe n'ejiji ha?
Ndị ntorobịa kwụpụtara uche ha banyere ụdị akwa ndị ọgbọ ha na-eyi na-eghewe ahụ ha oghe.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50873631
Igbo delicacies: Ị hụtụla ụgba pụrụiche maka ndị na-asọ anụ?
Ụgba bụ otu nrị masịrị ndị Igbo niile n'ụzọ pụrụịche mana ị ma na e nwereike ịgwọ ya n'ejighi anụ maọbụ azụ?
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51026846
Archbishop Adewale Martins ekwuola na amụma Mbaka buru maka Hope Uzodinma na-eme ihere
Archbishop Adewale Martins kọwara ebe ụlọụka Katọlik kwụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ma na Naịjirịa ma na mbaụwa.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51311220
Supreme Court Judgement: Lee ụmụnwaanyị Imo emeela ngaghariwe, ekpere ka a kpọghachi Ihedioha
Ụmụnwaanyị Imo emeela ngaghariwe na-akpo oku Ụlọikpe Kachasi kpegharia ikpe ha kpere ma kpọchigha Emeka Ihedioha dịka Gọvanọ Imo steeti.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51346147
Igbo Culture: Ihe mere e ji kwụsị ịgba mbarị n'obodo anyị
Ndị ichie obodo Imerienwe kọwara ihe mere ha esoghi ụkpụrụ ndị nna nna ha n'omenala ịgba mbarị.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51385106
"Ịgba egwu Salsa zọrọ ndụ m" - Emeka Adindu
Emeka Adindu bụ onye na-akuzi ma na-agbakwa egwu salsa akọwaala ihe mere ya o ji soro ụzọ egwu.
[]
[]
https://www.bbc.com/igbo/live/afirika-44288710
Biafra: Ahịa tọgbọrọ chakoo maka ncheta Biafra
Ka o si aga n'ihe gbasara ncheta Biafra na Naijiria na ụwa gburugburu taa bụ Mee 30, nke afọ 2018.
[]
https://www.bbc.com/igbo/live/afirika-45690975
APC Primaries: Ka o si gaa n'Imo steeti
BBC Igbo na-eweta akụkọ usoro ndị APC ji ahọpụta ndị ga-anọchite anya ha na ntuliaka gọvanọ na 2019 ka o si aga.
[]
https://www.bbc.com/igbo/live/afirika-47247701
Nigeria Election 2019: Ogbunigwe n'Ebonyi?
Akụkọ ihe na-eme na Naijiria gbaa gburugburu ka ọ fọrọ naanị otu ụbọchị tupu eme ntuliaka 2019.
[]
https://www.bbc.com/igbo/live/afirika-47263724
Election in Nigeria: Inec awụọla ụmụ Naijiria n'ala
Ihe na-eme na mpaghara Naijiria niile dịka Inec bugharịrị ntuliaka kara ime taa bụ Satọde Febụwarị 16, afọ 2019.
[]
https://www.bbc.com/igbo/live/afirika-47678135
Election Results: Ka o si gaa na mmeju Ntuliaka 2019
Akụkọ ihe na-eme na 'Alaigbo na gburu gburu Naijiria ebe a na-eme ntuliaka mmeju nke afọ 2019.
[]
https://www.bbc.com/igbo/media-42977758
Ọnụụzọ ụgbọelu DANA fekapụrụ n'Abuja
Ọnụụzọ ụgbọelu DANA fekapụrụ n'Abuja taa ka ha feturu
[]
https://www.bbc.com/igbo/media-44717089
Oke ogbugbu mmadụ ga-emebiri Buhari ntụliaka 2019-CBCN
Onye ode akwụkwọ ọgbakọ ahụ bụ Fada Evaristus Bassey ekwuola na ọ bụrụ na Buhari akwụsịghịnwụ oke ogbugbu na-eme na Naịjirịa, o ga-emebiri ya ihe na ntuliaka 2019.
[]
https://www.bbc.com/igbo/media-45699868
APC Primaries: Ọgbaghara dapụtara n'Enugwu steeti
Akụkọ na-eru BBC Igbo na ntị kwuru na ọgbaghara dapụtara ebe a na-eme ntuliaka imeụlọ APC n'Enugwu steeti.
[]
https://www.bbc.com/igbo/media-50873633
Christmas Carol: Lee etu ndị dara ogbi si abụ abụ ekeresimesi
Lee etu otu na-agụ egwu si gosi na ọrụsị abụghị ngwụcha ndụ onye ọbụla.
[]
https://www.bbc.com/igbo/media-50903506
Ọgbambọ: Etu m si hapụ ọrụ ọkaiwu kwawa akwa
Prince Uche si na ọ ghọrọ ịkwa akwa karịa ịrụ ọrụ ọkaiwu maka uru juru n'ime ya.
[]
https://www.bbc.com/igbo/media-50997777
Blind Mechanic: 'Ekpuru m isi mana ọ napụghị m ihe m ji bụrụ nwoke' - Abugu
Emeka Abugu kpuru isi kamgbe ọ dị afọ ise mana agbanyeghị ọdachị a, ọ na-arụ ọrụ Mekanịc, lụọ nwaanyị, ma mụta ụmụ asaa.
[]
https://www.bbc.com/igbo/45925845
Nnamdi Kanu: Ataghị m ya ụta - Umahi
Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi arịọla Nnamdi Kanu na ndị otu ya ka ha were ọnụ okwu karịa ọgụ wee chọta ihe ha na-achọ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/50662638
Gender roles: Onye kwesiri isi nri n'ụlọ n'ime di na nwunye?
Ndị ntorobia atụnyeela ọnụ na ndọrịtaụka gbasara onye kwesiri isi nri n'ụlọ n'etiti di na nwunye?
[]
https://www.bbc.com/igbo/51166312
Biafra at 50: 'Kaduna Nzeogwu na-ebugharị ogbunigwe n'akpa ya mgbe ọ dị ndụ'
Nwanne Patrick Kaduna Nzeogwu bụ onye agha Naịjirịa nakwa Biafra kọrọ BBC Igbo ihe ndị dị omimi Nzeogwu mere mgbe ọ dị ndụ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-44300254
Ojukwu 'zoro' agha ebe a
Ụbọchị taa na 1967 bụ afọ iri ise na otu ka Odumegwu Ojukwu na ndị otu ya hibere Biafra. Nhibe a bụtere ọtụtụ ihe na obodo Naịjirịa nke agha nọ na-isi ya.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45907295
"Ha achọghị ka m lụrụ nwunye m maka na a bụ m ohu"
Theophilus Onwura Nwafor na oyoo ya chere afọ 16 tupu ha lụọ onwe ha maka na Tony si na ezinaụlọ ndị ohu pụta.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-46277149
Okorocha: Isiokwu abụghị ịbụ ọgọ gọvanọ, ọ bụ ihe m ga-emere ndị Imo - Uche Nwosu
Uche Nwosu tinyere ọnụ n'okwu ịzọ ọchịchi n'Imo steeti nakwa etu ịbụ ọgọ Rochas Okorocha ekwesịghị igbochiri ya ụzọ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-46419968
World Braille Day: 'Abara m n'ọrụ nkuzi maka na ugwu adịghị n'ịrịọ arịrịọ'
Otu onye nkuzi kpuruisi akọwaala etu osi nabata ọnọdụ ya dịka onye kpuruisi ma were ya baa n'ọrụ nkuzi.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-46613005
Abakaliki Rice: Etu ụmụnwaanyị Ebonyi si eji ntụ ya akpa ego
Ihe a bụ ihe nkiri gosiri ka e si ahọchapụta ezigbo osikapa n'ime ntụ osikapa, ma were ya kpara ego.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-47789830
Anambra state: Ọgbaghara sochiri echichi Igwe Aguleri ọhụrụ
Ọgbaghara so echichi e chiri Michael Chinenye Idigo dịka Igwe Aguleri n'Anambara steeti nsonso a.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50186050
Igboukwu Art: 'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'
N'akụkọ a ka ị ga-ahụ ihe nka gbara Igbo ghari ndi mgbe ochie ji eme ọnụ n'Igboukwu.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50225826
Ọgba Mbọ: "Ego dị n'ịzụ ọkụkọ Bekee"
Ndị nwere mmasị ịzụ ọkụkọ Bekee nwere ohere ịmụta ya ebe a.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50328178
Uche Ntoroọbịa: Ị ga-eme enyi tupu ị malite alụmdinanwunye?
Ndị ntoroọbịa tinyere ọnụ n'okwu banyere ime enyi na njem alụmdinanwunye.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50365662
Nigerians in Ghana: Ihe a bụ ugboro asaa agbachiri ụlọahịa anyị n'afọ a - Ndị Naịjirịa
Ndị Naịjirịa na-azụ ahịa n'ahịa Opera dị na Ghana ekwuola etu e si gbachie ọdọahịa ha na mberede.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50396359
Rice Processing: Usoro e ji emepụta osikapa
Ụlọọrụ Cosmas Maduka nke ngalaba ọrụ ugbo gosiri etu ha si emepụta osikapa ọdịnala site n'ubi ruo n'ịgba ya n'akpa.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50547204
Ụlọelu a rụrụ n'elu ụgbọala
Abinet Tadesse hụrụ ụgbọala ya n'anya. Ọ chọkwara ebe ọ ga-ebi. Nke a mere ka ọ rụọ ụlọ n'elu ụgbọala ya.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50550975
Chukwuemeka Ezeife: Mbụ ihe e jiri mara ndị Igbo bụ eziokwu
Ọ gwara BBC Igbo na agwa ndị Igbo agbanweela maka na ha anaghị ekwu eziokwu.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50619964
World Disability Day: Nwaanyị kpuru isi na-eme achịcha
Etu Amarachi Onyedilefu kpuru isi si eme achịcha bekee nke ya ga-akpalite mmụọ gị.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50635540
Omu of Okpanam: Ị hụtụla Ezenwaanyị na-alụ nwaanyị ibe ya?
Ezenwaanyị Martha Onyemechi bụ eze nwaanyị pụrụiche n'ala Igbo niile n'ihi na ọ na-alụ nwaanyị ibe ya.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50802088
Josephine Ugwu: Nwaanyị ritere ụlọ site n'iweghachi ego ruru $12m
Josephine Ugwu ritere ụlọ maka ịkwụwa aka ọtọ weghachi ego karịrị nde naịra anọ na ụma.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50815409
Sex Trafficking: Ụmụagbọghọ Afrịka a tọrọọ gaa ịgba akwụna na India
Ngalaba BBC 'Africa Eye' nyopuru otu ndị ekperima ji ụmụnwaanyị Afrịka agba mgbere n'India.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50827582
Christmas Day: Kedụ ka ahịa Ekeresimesi si ada n'ogbe gị?
BBC Igbo bara ime ahịa i me nchọpụta etu akwa na ihe ndị ọzọ si adala ọnụ n'oge ekeresimesi a.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50950624
Imo state: Etu Ekeresimesi n'ọchịchị Ihedioha si dị iche na nke Rochas
Lee ihe ndị Imo steeti kwuru maka ihe dị iche n'etiti Ekeresimesi oge ọchịchị Rochas na nke Ihedioha.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50950627
2019 in summary: Were anya gị gbaa nkiri
Bia kirie ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ BBC Igbo wetere ụnụ n'afọ 2019.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51018112
Ọgba mbọ: Ị ma Erisco? Lee ka N4200 si mụtara ya ụlọ mmepụta tomato kachasị n'Afrịka
Eric Umeofia, onye nwe Erisco Foods gwara BBC Igbo ihe mere o ji hapụ ị na-atụbata ahịa hara nnrụpụta n'agbanyeghị na ọ dịghị fecha fecha.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51078948
Oriental Brothers: Maka na m bụ onyeisi, ha chere na m na-eri ego nanị m - Kabaka
Dịka a na-agunye Orienta Brothers na ndị bidoro Highlife na Naijirịa, otutu amaghị etu ha si bido na ihe mere ha jiri gbasaa.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51107146
Biafra 50 years after: O meela afọ 50 a lụrụ agha Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme
Lee akụkọ maka agha Biafra a lụrụ n'afọ 1967 rue 1970
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51159849
Children of Biafra: Ihe ndị etobeghi ntoroọbịa hụrụ oge agha
Ndị bụ ụmụaka oge agha Biafra kọrọ ihe ha hụrụ na etu ha siri bie ndụ n'oge ahụ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51178109
Father Mbaka: Ekpere m ekpere, buo ọnụ ọtụtụ ụbọchị ruo mgbe amụma Hope Uzodinma mezuru
Fada Mbaka ekwuola etu o siri buo amụma o sị mezuru maka ntuliaka Gọvanọ Imo steeti.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51267089
Nigerian Politics - Mbaka, ị bụghị Yahoo Pastor - Charly Boy
Onye oti egwu a ọnụ na-eru n'okwu si ka agbaa mbọ hụ na ndị na-achị ereghị obodo were ego maa n'akpa.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51273068
Nwaanyị na-alụ ọgụ iji kwụsị ụmụagbọghọ ịgba akwụna
Na Congo, ịgba mgba abụrụla ihe na-enyere ọtụtụ ụmụnwaanyị aka ịgbanarị ndị chọrọ iwakpo ha.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51287668
Lassa Fever Outbreak:Etu e si lie nwaanyị Lassa Fever gburu
Odeakwụkwọ Mịnịstrị ahụike n'Enugwu bụ Ifeanyi Agujiobi kọwara etu e si lie nwaanyị ọrịa lassa fever gburu nakwa etu gọọmentị si ebuagha megịde ọrịa ọjọọ a.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51292741
Igbo Language: Million, Billion na Trillion bụ gịnị n'Igbo?
Million, Billion na Trillion bụ okwu mmadụ niile na-anụ mgbe niile mana gịnị ka ọ pụtara n'asụsụ Igbo?
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51298925
Balogun Market Fire: Ọkụ agbatuola ụlọahịa abụọ n'ahịa Balogun Legọs
Ọkụ na-erepịa ngwaahịa ndị na-ere ahịa dịka ha na-agba mbọ ịzọpụta ọtụtụ ihe na Legọs Aịland.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51325661
Ihe mere e ji akwanyere nwaanyị nọ na nsọ ugwu
Nwaanyị nọ na nsọ anaghị arụ ọrụ dị iche iche n'ala Igbo.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51338296
Football Freestyle: 'Eji m iko bọọlụ enyere onwe m aka n'ụlọakwụkwọ'
Nwada Blessing Faith Onyemaucheya bụ onye na-agba bọọlụ kọwara etu o si malite iji iko bọọlụ enyere onwe ya aka n'ụlọakwụkwọ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354017
Keke Ban: A napụla anyị na ụmụ anyị nri n'ọnụ
Ndị Legọs akwaala arịrị n'ihe ha na-agabiga n'ihi mmachi gọọmentị steeti ahụ machiri Keke na Okada.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354207
Rev Emmanuel Obimma kwuru na ọ ma na 'wayo' ga-abanye n'ikpe Hope Uzodinma
Ụkọchukwu ndị ụka Katọlik a ma dịka Fada Ebube Mmụọnsọ, gwara BBC Igbo ihe o che maka ikpe Hope Uzodinma na ọnọdụ Naịjirịa ugbua.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51368121
Imo State Election: Agbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị
Emeka ihedioha kọwara ihe mere o ji sị ka ụlọikpe kachasị lebagharịa anya n’ikpe dị n'etiti ya na Hope Uzodinma.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51372241
China Coronavirus: Mba China sị ka anyị ghara ikwu maka ọrịa a - Onye Naịjirịa nọ na China
Nwata akwụkwọ Naịjirịa na-agụ na mahadum dị na Chaịna ekwuola ọnọdụ ha nọ ka ọrịa Coronavirus a na-efegharị.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51378911
World Cancer Day 2020: "Etu m si chọpụta na m nwere Cancer" - Anwuli Ojogwu
Akụkọ maka nwaagbọghọ gbakere n'ọrịa kansa.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51390842
Imo state: "Ihedioha nwereike ịga mkpọrọ ma ọ kpachaghị anya" - Mbaka
Ụkọchukwu Adoration Ministry bụ Ejike Mbaka adọọla Emeka Ihedioha aka na ntị.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51400947
Female Genital Mutilation: 'A na-erosi m iro makana a chọrọ m ka a kwụsị ibi nwaanyị ugwu'
Mary Udumeke bụ onye na-agba mbọ ka akwụsị ibi nwaanyi ugwu n'Ebonyi steeti. Ọ gwara BBC Ihe ọ na-agabiga maka agha a ọ na-alụ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51425003
Simon Odo: 'Abụ m Eze Ekwensu, Ekwensu bụ nna m'
Simon Odo bụ onye dibia e ji Eze Ekwensu mara kọwaara BBC Igbo etu o si nwete aha ahụ nakwa ihe ndị ọzọ banyere ya.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51444921
Africa Eye: Etu ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa si eji 'tabay torture' ata ndị mmadụ ahụhụ
Iwu Naịjirịa anabataghị ịta ndị mmadụ ahụhụ, mana ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-eji ntaranahụhụ dị icheiche emekpa ndị mmadụ ahụ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51450721
Car maintenance: Lee ihe ndị ị kwesịrị ime tupu ị nyapụ ụgbọala gị kwa ụbọchị
Ụfọdụ ndị anaghị eleru anya tupu ha anyapụ ụgbọala, mana akụkọ a ga-akụziri gị ihe ị kwesịrị ịma.
[]
https://www.bbc.com/igbo/live/51090297
Biafra at 50: Izu a kwụsịrị agha Biafra
Akụkọ, mmemme na ihe niile gbasara agha Biafra na mgbe o biri n'afọ 1970
[]
https://www.bbc.com/igbo/media-51222237
Emume ọkazị Emii: Ihe mere obodo a jiri akwanyere akwụkwọ nrị a ugwu
Ebe ọtụtụ obodo n'Igbo na-eri ọkazị, ọ bu ndị Emii na-ahu ha ka ihe abụghi naanị akwụkwọ nri. Lee ihe kpatara ya.
[]
https://www.bbc.com/igbo/42712250
Ekweremadu: Ike agwụla ndị ụlọ ome iwu
N'ihi oke ogbugbu ndị mmadụ na Naịjirịa gbagburu gburu, osota onyeisi ndị ome-iwu Naịjirịa bụ Ike Ekweremadu ekwuola na ihe Naịjiria chọrọ bụ nchekwa tara ọchịchị, tupu ekwuwa okwu ihe ọzọ.
2018-01-19T17:07:38Z
Ekweremadu: Ike agwụla ndị ụlọ ome iwu
Ike Ekweremmadụ Ike ịda jụụ otụ nkeji banyere oke ogbugbu na-eme n'ala Naijiria agwụla Ekweremmadụ Osote onye-isi ndị ome-iwu Naịjirịa bụ Ike Ekweremadu ekwuola na ike agwụla ndị Sịnatị iji otu nkeji darajụụ akwanyere ndị egburu n'ime oke ọgbaghara dị na Naịjirịa oge ọ bula. Ekweremadu katọrọ mwakpọ na ogbugbu ndị Naịjirịa aka ha dị ọcha nke ndị Fulani na-achị ehi mere, kwuo na ike agwụla ndị ome- iwu ịkwanyere ha ugwu n'otu nkeji' Cheta n'otu ịzụka gara-aga ka emere akwam ozu mmadụ ruru iri asaa egburu na Local Gọọmenti Logo na Guma nke Benue Steeti, e be ihe kariri mmadụ iri ise ka akụkọ kwuru n'egburu na Taraba Steeti. Ekweremadu gosiri iwe gbasara ogbugbu ndị mmadụ na nzukọ ndị ome-iwu n'ụbọchị taa, kwuo na Naịjirịa ga-ebu ụzọ nwe udo na nchekwa, tupu e kwuowa okwu iwulite obodo. Ọ sịrị: "Ndị ome-iwu abụghị sọ ọsọ ndị ihe a metụtara, kama ndị Naịjirịa niile. 'Ike agwụla anyị iji otu nkeji dị jụụ maka nkwanye ugwu. Ihe anyị chọrọ bụ udo na nchekwa tupu echewa echịchị nwuli obodo."
[]
https://www.bbc.com/igbo/42712413
'Akụkọ m ga-akarị nke a' - Simone Biles
Simone Biles, nwata nwanyị na-anọchite anya Amerika na egwuregwu mmega ahụ(gymnaastics), ekwuola na dokịta na-eletabu otu ha bụ Larry Nassar metọrọ ya n'ụzọ mmekọahụ mgbe gara aga
2018-01-19T17:09:56Z
'Akụkọ m ga-akarị nke a' - Simone Biles
Simone Biles Simone kwuru na ọ gaghị ekwe ka ihe mere zuru oọṅụ ya Simone kwupụtara nke a n'elu igwe okwu, Twitta, jiri akụkọ a na-akpọ #MeToo na bekee. Ọ sị na ọ gaghị ekwe ka ihe mere "zuru ọṅụ m na obi aṅụrị m." O kwuru sị: "Ọ hịara m ahụ ị cheta ihe ndị a, ma na-agbawa m obi na ịlaghachi azụ ebe ahụ o mere dị mkpa na imezu ebumnobi m maka ị ga asọmpị Tokyo n'afọ 2020." Mana Simone gwakwara ndị n'eso ya na ọ gaghị eme ha ihe nwute, na ọ ga-aga n'iru n'imeri na ihe ọ hụrụ n'anya bụ egwuregwu mmega ahụ. Gịnị bụtere okwu a? Ndị uwe ojii wakporo, Larry Nassar, onye bụ dokịta ochie na-eleta ndị otu egwuregwu Amerika niile na Disemba afọ gara aga maka mpụ gbasara ụmụaka n'ịhe mmekọrịta nwoke na nwanyị. Ihe dịka ụmụ nwanyị narị iri atọ akpụrụ la Nassar, bụrụ kwa ọka-mmụta na Mahadụm steeti Michigan, ga ụlọ-ikpe maka mmetọ o mere ha. Nassar kwuputara na ọ metọrọ ndị otu egwuregwu Amerika ndị ọzọ. Ọ bụ ka nke a na- aga ka Simone jiri kọ akụkọ nke ya.
[]
https://www.bbc.com/igbo/42775969
Mmadụ nde 750 enweghị ọrụ kemgbe 2016
Buhari kwere nkwa na ọ ga enye orụ, mana NBS na akọwa na mmadụ nde narị enweghị ọrụ.
2018-01-22T13:48:04Z
Ọrụ adịghi: Mmadụ nde narị asaa na ọkara enweghị ọrụ kemgbe 2016
Nwaanyị na eri ji na akara Ọtụtụ mmadụ na arụ ọrụ aka, mọ na azụ ahia Mgbe Muhammadu Buhari na-azọ ọchịchị, otu ịhe bụ okwu ọ kpụ n'ọnụ bụ nkwa ọ ekwere na ya ga enye ndị mmadụ ọrụ. Okwu a Buhari kwuru na isi ndọrọndọrọ ọchịchị na 2015 bu ịhe eji kpụrụ ya na ọnụ ugbua, ọkachasị ka ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọnụ ọgụgụ a na-akpọ National Bureau of Statistics (NBS) nwepụtara ozi n'akọwa na mmadụ ruru nde asaa na nari ise so na ndị enweghi ọrụ kemgbe afọ 2016. NBS kwuru nke a na akwụkwọ ọ kpọrọ "Labour Force Statistics Vol. 2: Employment by Sector Report,". E wepụtara akwụkwọ a na Abuja n'ụka a gara aga. Ke ihe ozi a pụtara? BBC Igbo jụrụ Cheta Nwanze, bụ onye na arụ na SB Morgen bụ ụlọ ọrụ aka ha dị na nkọwa otu ịhe sịrị dị. Cheta gwara anyị na ihe dị na ọrụ nkọwa ihe ọgụgụ na enwe otu ọ dị, mana ọ sị na nnụkwụ ịhe mere na ụlọ ọrụ dị ichiche na Naịjịra n'ime afọ abuo gara aga. "Achụrụ nwunye m na ọrụ mgbe Naịjirịa na ndị MTN nwere nsogbụ ọ were metụta ebe o na aru ọrụ. Okwu MTN ahu metutakwara ọtụtụ ụlọ ọrụ ha na ha na arụkọ ọrụ ka MTN ekweghị inye ha contract. A mam ọtụtụ ndị mmadu na arụbụ ọrụ na Proctor and Gamble, mana achụkwara ha n'ọrụ mgbe ụlọ ọrụ ahụ chụrụ oke anọ ndi ọrụ ha. Yabu ịhe metutara ọtụtụ mmadu," Ka Cheta Nwanze siri kwu. Ụfọdụ ụmụaka (ọ bụrọ ndị egosiri eba) anọghịzị na akwụkwọ maka nne na nna ha enweghị ọrụ BBC Igbo juru Nwanze maka okwu ndị gọọmenti Naịjirịa na ekwu banyere imepụta ọrụ. Ọ sị na "nchọpụta ndị NBS na-akowa na ọrụ mmepụta mmanụ agbịdị agaghị n'ihu ka ọ sị kwesi. Nke a na egosị na agbaneghi na ego batara na ọrụ gbasatara mmanụ agbịdị, madụ ole ka ana ewo na ọrụ na mpaghara a? Mgbe e mere mgbakọ, ị ga ahụ na ịhe sirị ike ọfụma" BBC Igbo kpọrọ ndị na-ekwuchịtere gọọmenti Naịjirịa ka ha kwuo uche ha banyere ịhe a NBS wepụtara mana onweghị onye zara n'ime ha. Mana, gọọmentị Buhari weputara N-POWER, School Feeding Programme na ndị ọzọ dị na ime ịhe ha kpọrọ 'Social Empowerment Programmes' ha sị na ha ga ejị nyere ndị mmadụ aka na Naịjirịa.
[ "Naijiria", "Ọrụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/42786449
Google ekpupurula Keshi okpu
Ndị ụlọọrụ Google ji ụbọchị ncheta ọmụmụ Stephen Keshi kwanyere ya ugwu n'agbanyeghi na ọ bụ ụbọchị ọ gaara agba afọ 56.
2018-01-23T10:33:14Z
Google akwanyerela Keshi ugwu n'ọnwụ
Google doodle Google na-echeta ụbọchị ọmụmụ Keshi Iji cheta ọmụmụ onye nkuzi bọọlụ Najiria a ma ama bụ Stephen Keshi, Google kwanyere ya ugwu n'ụzọ pụrụiche site na ime ka akara e ji achọta ihe n'igwe intanetị bụrụ ihu ya. Taa bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Jenuwarị 2018, bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Keshi onye nwụrụ n'afọ 2016 ka ọ gbara afọ 54. Ihe i kwesịrị ịma maka Christy Essien-Igbokwe Femi Otedola ekwetala ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ ruru $50,000 maka Christian Chukwu Google Africa kwuru n'igwe okwu Twitter sị: "Taa, anyị na-akwanyere onye egwuregwu bọọlụ a ma ama, Stephen Keshi ugwu. Egwuregwu bọọlụ bugharịrị Keshi ụwa niile dịka onye ọgba bọọlụ na onye nkuzi bọọlụ. Ọnụ ọmụmụ, nna nnukwu!" Ihe a Google mere, mere ọtụtụ ndị Naijiria obi ụtọ, mekwa ka ha chetakwa ndụ na ike Keshi kpara n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ na Naijiria mgbe ọ dị ndụ: Keshi meriri iko mba Afrika na 2013 Mutiu Adepoju, onye ya na Keshi gbakọrọ Naijiria bọọlụ, gwara BBC na, "Keshi bụ onye hụrụ ndị mmadụ n'anya. Echetara m oge m banyere "National Team" mgbe ahụ ọ bụ onye ndu anyị, ọ bụ ezi onye ndu. Keshi bụ onye a ma ama. Ọ nọzịghị ndụ mana a ga-eji ihe ọma ndị o mere mgbe ọ dị ndụ were na-echeta ya." Keshi chịrị ndị otu egwuregwu Super Eagles kemgbe afọ 2011 ma durukwa ha gaa asọmpi dị iche iche nke gụnyere; Iko Mba Afrika na 2013 (nke ha bulatara Naịjirịa), iko mpaghara Afrịka dị iche iche na 2013, ma nye aka wetara Naijiria ọnọdụ n'asọmpi Iko Mbaụwa niile na 2014.
[ "Naijiria", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Bọọlụ", "Ọkwa ọnwụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/42787750
Alexis Sanchez a baala otu Man United
Alex Sanchez bụzị onye egwuregwu Manchester United
2018-01-23T11:41:21Z
Kedu ka Sanchez sịrị baa Manchester United?
Alexis Sanchez Alexis Sanchez na-enye goolu nke ọma Onye egwuregwu bọọlụ Alexis Sanchez e binyeela aka na akwụkwọ ndị otu Manchester United. Manchester United jị nde euro ịrị na anọ (E14m) zụtara Sanchez n'aka ndị Arsenal. Otu Manchester City kwusịrị mmasị ha n'ebe Sanchez nọ n'ịzụka nke gara aga makana ha che na nnabata Sanchez ga-emetụta emume ndị otu egwuregwu ha. Manchester United ekwuola na Sanchez ga-eyi uwe akara asaa. Sanchez ga-esokwa na asọmpị ndi Red Devils na otu di iche iche na English premier League akpọrọ FA cup ga-agba n'ubọchị ịrị na isii na ọnwa Januwari. N'akụkọ yịrị ibeya Henrikh Mkhitaryan a baala otu Arsenal. Sanchez na Mkhitaryan na ọnụ ogwụgwụ 4 Ka mgbe ọ bara Arsenal na afọ 2014, Sanchez enyela goolu ruru iri isi. Nani Romelu Lukaku, Sergio Aguero na Harry Kane bụ ndị ka ya nye goolu. Na asọmpi ya niile Sanchez nyere goolu iri asatọ kari ndi eguregwu ọzọ na otu Arsenal. Emerigo Arsenal ugboro atọ ka mgbe Sanchez kwụsịrị ịgbaru ha bọọlu. Mkhitaryan agbaala ndị Manchester United asọmpị ru iri isi na atọ, nyekwa goolu iri na atọ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/42787749
Gọọmeentị Amerika emeghela
Trump na ndị omeiwu US ekwekọrịtala maka itinye aka n'akwụkwọ ka ọrụ malite ọzọ na mba ahụ.
2018-01-23T11:45:10Z
Trump na-asị na mmepe gọọmenti Amerịka bụ ihe mmeri ndị Republican
Donald Trump Donald Trump na-ekwu okwu ike gbasara ndi mbịabịa Ụlọ nzụkọ ome iwu US ekwekọrịtala maka itinye aka n'akwụkwọ ka ọrụ malite ọzọ na mba ahụ. Cheta na ndị Democrat na ndị Republican sere okwu maka itnye aka na ya bu akwụkwọ maka ha ekwekọrịtaghị na ihe gbasara nkpata na mmefu akụ bụ bọjet. Ndị otu Demokrat kwuru na ndị Republicans kwetara na ha ga-eme nkparịta ụka maka onọdụ ndị mbiambia bị n'ala US. Ha ga-elebaanya n'iwu nke a na-akpọ Deferred Action for Childhood Arrivals (DACA) n'olu bekee bụ iwu na-agba mgbọ hụ na ndị umuaka ndị mbiabia nwere ike ị bị na US. Trump na-atụrụ ndị ekwekọrịtara na mmeri ya aka. Mana ugbua, ọchịchị Trump akabiela iwu ahụ. Nke a pụtara na iwu nke a ga-akwụsi n'ụbọchị ise na ọnwa nke maachị. Onye na nọchịte anya ndị Demokrat n'ulọ omeiwu bụ Steny Hoyer arịọla ndị otu ibe ya ka ha lebaa anya na ya bụ okwu. Maka akụkọ gbasara mmechi Amerika, gụọ: Mmechi ọrụ na Amerịka
[ "Donald Trump", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/42789071
Imo Steeti agaghị amaputa ala ọbụla maka ndị na achị ehị
Rochas Okorocha ajula ị nye ndị Fulani na achụ ehi ala n'Imo Steeti maka na-ọdịghị n'iwu Naịjirịa
2018-01-24T08:06:32Z
Rochas Okorocha: 'Ndị asịrị kpachara anya ha!'
Rochas na ala Fulani na achụ ehi Ọtụtụ ndị Imo Steeti akwadoghị ị nye ndị Fulani na-achụ ehi ala Gọvanọ na-achị Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na onweghị ala ya ga amaputa maka ndị Fulani na achị ehi n'Imo Steeti. Okwuru nke a unyahụ bụ mkpụrụ ụbọchị Jenụwarị iri abụọ na atọ n'ọwerri, isi obodo Imo Steeti. Okwuru nke a site n'onu komishiona na-ahụ maka mgbasa ozi bụ ọkammụta Nnamdị Obiaraeri. Ozi ahụ kwuru na onweghị mgbe Gọvanọ Rochas jiri chee echichi ị nye onye ọbụla ala ndị Imo steeti. O kwukwara na-asịrị niile ana anụ maka ịnye ndị Fulani na-achị ehị ala ndị Imo Steeti bụ ọrụaka ndị iro nakwa ndị mgbam na ndị ntụ. Akwụkwọ akụkọ ekwubuola na Gọvanọ Okorocha sị na ya ga-enye ndị na achị ehị ala n'Imo Steeti nke ọtụtụ ndị Igbo katọrọ na ezoghị ọnụ. BBC Igbo gbara mbọ I kwuru Oje ozi Rochas maka mgbasa ozi mana nwaamadị ahụ bawara BBC mba gbanuọ ekwenti ya. Ka ọdị ugbua, ndị Gọvanọ ndị ọzo n'ala ịgbo ekwuola na ha agaghị amapụta ala ọbụla maka ị nye ndị Fulanị na-achị ehị. Ohaneze Ndị Igbo akabichiela na onweghị onye ga enye ala ndị Igbo maka ịchị ehi. Na River Steeti, Gọvanọ Nyesom Wike ekwuola na ya nweghị ala ya ji arụ ọrụ ma ya fọkwa nke ya na-enye mmadụ.
[ "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/42802133
Isiokwu di n'akwụkwọ Obasanjo degara Buhari
Onye bụ buru onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ewepụla nkwado ya n'ebe onyeisi ugbua bụ mohammadu Buhari
2018-01-24T10:43:46Z
Ihe ndị pụtara n'akwụkwọ Obasanjo degara Buhari
Obasanjo chịrị Naịjirịa afọ asatọ na ọchịchị onye kwuo uche ya Obasanjo chịrị Naịjirịa afọ asatọ na ọchịchị onye kwuo uche ya Dịka ọtụtụ ndị n'ekwenye na akwụkwọ a Obasanjo degara onyeisiala bụ Mohammadu Buhari na ọ bụ ihe ziri ezi, ụfọdụ ndị akatọla ya, kwuo na Obasanjo bụ onye ama ama n'idegara ndị isiala akwụkwọ. Ugbua ka anyị were ohere a nyocha ihe ndị pụtara ihe na akwụkwọ a nke Obasanjo zigara onyeisiala Buhari nke ọkpọrọ igwu dịna emeghị nkeọma Gọọmenti etiti, Oke agụụ na ụbịam Enweghị nchekwa/nsogbu ndị ọchị ehi Ahazịghị akụnaụba nke ọma Mgbahapụ ọrụ dịrị mmadụ Ikpuchi ihe ọjọọ Enweghị ọganihụ na olile anya Enweghị nchịkọta obodo Ịkpa oke agbụrụ
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị" ]
https://www.bbc.com/igbo/42807376
Onweghi onye nwụrụ n'ime ọkụ tanka agbara ọkụ na Legọs
Otu tanka bu mmanụ ụgbọ-ala ruru lita puku iri ato na ato agbaala ọkụ na Ojo Legos.
2018-01-24T19:33:18Z
Tanka bu mmanụ ụgbọ-ala agbaala ọkụ n' Ojo
Ijegun fire Ọkụ tanka agbala ọtụtụ mmadụ na oge gara aga na Legos Onyeisi ndị na-emenyu ọkụ na, Legọọsi steeti bụ Rasak Fadipe ekwuola na onweghi onye nwụrụ n'ime ọkụ ahụ gbara n'ehihie ụbọchị 24 Jenuwarị, 2018. Ọkụ tanka bu mmanụ ruru puku iri atọ na atọ n'ime ya, gbaara ọkụ n'Ojo, Lagos Steeti. Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ na-agbaọsọ ndụ n'ebe ahụ. Rasak Fadipe gwara ndị ntaakụkọ na "Ozugbo m nụrụ maka ọkụ a ka m kpọrọ ndị na-emenyụ ọkụ dị n'Ọjọ, ha gbatakwara ebe ọkụ a na-ere." "Mana mgbe anyị ruru ebe a ka anyị hụrụ na ọ bụ mmanụ ụgbọala na-agba ọkụ. Ọ bụ mgbe ahụ m kpọkọtara ụlọọrụ ndị ọzọ na-emenyụ ọkụ ozugbo ozugbo." Okwu mmanu ugbọala gbara n'uzọ ana-agbakarị "Ndiuweojii na ndị agha mmiri nyere ndị Lagos State Emergency Management Agency (NEMA) enyemaka ịmenyụ ọkụ ahụ n'elekere atọ na nkeji iri atọ nke ehihe" Olayinka Ajaba bụ onye nnọchịanya NEMA kwuru na nsogbu nke a sị n'oge ha jị aka na-amịpụta mmanụ ụgbọ ala . Onye isi ndịuweojii n'Ijegun bụ SP Audu Ibrahim, gwara ndị ntaakụkọ na ha gbaara mbọ hụ na udo di mgbe ya bụ ọkwụ na-agba. Ugbua, ndi obibi Ijegun Ibasa ekwuola na ha chọrọ ka gọọmentị Lagos steetị guzobe ulọ mmenyụ ọkwụ n'akụkụ ebe ahụ dika NAN sịrị kọọ.
[ "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/42814501
Ihe nkiri zikọrọ otu esi gbuo ndị agha Amerịka na Niger apụtala
Ozi si n'aka ndị agha Amerịka siri na ha na enyocha ihe nkiri na ewu na Twitter.
2018-01-25T11:39:15Z
Ihe nkiri zikọrọ otu esi gbuo ndị agha Amerịka na Niger apụtala
Ozu onye agha Amerịka E nịela ndị agha Amerịka nwụrụ na Niger Ndị agha Amerịka si na ha na-eleba anya na ihe nkiri n'ewu ewu na intanet nke na-egosi ndị nwụrụ anwụ a sịrị na ha bụ ndi agha Amerịka ndị oyi egwu wakporo na afọ 2017 na mba Niger. Ozi si na mpahara ndị agha Amerika na ahụ maka Afrịka a na-akpọ African command (USAFRICOM) siri: "Anyi na enyocha akara twitter bu ozi a, iji mara ma ọ bụ na ezi na onwere ihe nkiri so ya." Ha kwukwara na ha agaghị ekwu ihe ọzọ banyere ihe a ma ọ bụrụ na ha emechaghi nyocha. Na ọctoba 4, 2017, mmadụ iri na abuo ndị agha Amerịka na mmadụ iri atọ ndị agha Niger ka ndị oyi egwu wakporo na Tongo Tongo, bụ obodo di na ọdịda anyanwụ nke mba Niger. Akụkọ na akọwa na ihe ruru mmadụ iri ise ndị oyi egwu ji ngwa agha dị ichiche, ọkacha ndị a na-akpọ machine gun na rocket-propelled grenade na asụsụ bekee bu ndi kpara arụ a. Otu onye ndị nchọpụta dere na twitter na ndị oyi egwu a zipuru ihe nkiri a sikọrọ ozu ndị agha Amerịka na otu onye agha meruru ahụ. Ndị agha a nọ na ọrụ ị nwete akụkọ maka ndị isi ndị otu otu egwu no na mpahara Niger ahu. Ndị Amerịka nwere ihe ruru ndị agha nari asato na Niger, ụlọ nta akụkọ Hill, bụ ndị buru ozi a na mbụ, kwuru.
[ "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/42821146
Super Falcons enweela onye nkuzi ọhụrụ
Onye isi otu egwuregwu bọọlụ na Naijiria Amajụ Pinnick ekwuola na Thomas Dennerby bụ onye nkuzi ọhụrụ otu Super Falcons
2018-01-25T19:20:53Z
Thomas Dennerby bụ onye nkuzi ọhụrụ Super Falcons
Thomas Dennerby Thomas Dennerby di afọ iri ise na isi Otu egwuregwu Super Falcons nke ala Naijiria enwela onye nkụzi ọhụrụ aha ya bụ Thomas Dennerby. Onye isi otu egwuregwu bọọlụ na Naijiria bụ Amajụ Pinnick kwuru nke a n'elu Twita. Super Falcons emeriela na asọmpi iko ụmụ nwanyị Afrika ugboro asaa Ozigbo ụfọdụ ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n' anya nụrụ nke a ha bidoro na-ekele Pinnick n'elu Twita. Dennerby bụ onye egwuregwu bọọlụ otu Hammarby na Sparvagens na oge gara aga. O sokwa na otu ndi egwuregwu bọọlụ ụmụ okorobia dị afọ iri abụọ na otu nke Sweden. Dennerby rụkwara ọrụ ndị uwe ojii. Bụrụkwa onye nkụzi nke otu Allsvenskan na Hammarby na afọ 2001.
[]
https://www.bbc.com/igbo/42850062
China arụpụtala anụmanụ na-amụghị amụ
Ụlọ ọrụ sayensi na China bụ nke mbụ arụpụtala anụmanụ 'Primate' na amụghị.
2018-01-28T12:50:02Z
China arụpụtala anụmanụ na-amụghị amụ
Ndị mmadụ akatọọla akụkọ na-apụta maka ụmụ enwe abụọ a rụpụtara n'ụlọ sayensi n'ihi na ha-sị na ọ ga-adị mfe ị rụpụta mmadụ etu aha.
[ "China" ]
https://www.bbc.com/igbo/42880244
Ndi agha Naijirịa agọrọla isi ha
Amnesty international ebola ndi agha nigeria ebubo na ha na ndị ọchụ ehi na- egbu mmadu na egbuko na otu akpa Numan, Adamawa state.
2018-01-30T19:27:50Z
Amnesty Intl': Ndi agha Nigeria na ndi ọchụ ehị na-egbukọ na otu akpa
Oteela ndị agha Naịjirịa ji arụ ọrụ nzọputa na North east Okwu a pụtara mgbe ndi Amnesty International kwuru na ndi agha ugbọ elu ala Nigeria jiri ụgbọ elu nke government wee nyere ndi na-egbu mmadụ bụ fulani herdsmen aka ka ha wakpo ndị obodo. Ha kwuru na akụkọ ahụ bụ asi. Ndi agha siri na ọ bụ ihe mwute na ndi amnesty kwuru na ha napụrụ ndi numan na obodo ndị gbara ha gburu gburu ikike diri mmadụ Onye ihe gbasara ndi agha na ọha na eze di na aka, bu Air Vice Marshal Adetokunbo Adesanya kwuru na ndi agha bụ ndi azụrụ nke ọma, na ha anaghi anapụ onye ọbụla ikike diri ya. Odoro anya na onweghị mgbe ndi agha jiri kwado otu ndi Ọchụ ehị na ọgụ ahụ were kọwaa ebubo ndi amnesty dika nke na erijughi afọ. Adesanya kọwara na ubọchi nke anọ december na afọ 2017, a kpọrọ ndị agha ugbọ elu ka ha gbata ọsọ enyemaka maka ọgu na ada na obodo Numan na Adamawa state, mgbe ha rutere ha hụrụ ọtụtụ ndi mmadụ na emebisi ihe, na agba ụlọ ọkụ. Ọ gwara ọhaneze na onweghi mgbe ndi agha jiri gbaa ụlọ ọkụ, gbuo mmadụ, ma ọbụ kwado ndi na achụ ehị ka ha daa iwu obodo.
[]
https://www.bbc.com/igbo/42884850
Ọchịchị mba Amerịka: Trump arịọla ịdịnaotu
Onyeisiala mba Amerịka ekwuola maka "otu ezinaụlọ mba Ameịka" mana ndị otu pati Demokrat si na ọ "gbajiela" Amerịka.
2018-01-31T07:54:55Z
Ọchịchị mba Amerịka: Trump arịọla maka udo na ịdịnaotu
Donald Trump Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump emela mgbasa ozi nke mbụ gbasara etu ọchịchị Amerịka si aga kamgbe o were ọchịchị n'afọ 2017. Trump site na mgbasa ozi ahụ o mere kwuru na ya na-enye ndị otu pati Demokrat ohere ka ha rụkọ ọrụ. Trump kwukwara na ya chọrọ ka ụlọmkpọrọ a na-akpọ Guantanamo Bay ghere oghe na-eweghachi iwu onye buburu onyeisiala Amerịka bụ Obama nyere ka emechie ya. Akụnaụba mba Amerịka na-arị elu mana ndị mmadụ anabataghị onyeisiala ha bụ Trump.
[ "Donald Trump", "Amerika" ]