source
stringlengths
0
47
title
stringlengths
0
100
description
stringlengths
0
502
date
stringlengths
0
20
headline
stringlengths
0
113
content
stringlengths
0
9.43k
tags
sequence
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50807058
Ntuliaka, mkpọrọ Orji Uzor Kalu na ihe ndị ọzọ kporo ọkụ na ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 2019
Afọ 2019 kworo ekwo ma zụọ azụọ n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.
2019-12-23T12:34:21Z
2019 Summary: Ntuliaka, mkpọrọ Orji Uzor Kalu na ihe ndị ọzọ kporo ọkụ na ndọrọndọrọ ọchịchị na 2019
Buhari/OUK Bido na ntuliaka iji họputa onyeisiala ruo na mkpọrọ a tụrụ aka chịburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu, Ị nwereike ikwu na afọ 2019 bụ chi bọọ a nụ ozo. Lee ihe iri kachasi kpoo ọkụ: 1. Mwepụ Ọkaikpe ukwu Onnoghen Onyeisiala Muhammadu Buhari wepụrụ Walter Onnoghen dịka onyeisi ọkaikpe n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Jenụwarị. Buhari kwuru na ọ bụ maka ebubo nrụrụaka e boro Onnoghen kpatara o ji wepu ya n'ọkwa. Ọkaikpe Walter Onnoghen awụsala ọwa n'ọrụ ya Buhari amaghị maka mkpụpụ akpụpụrụ Ọkaikpe Ukwu Naijiria n'ụlọikpe - Osinbajo 2. Mbugharịụbọchị ntuliaka Ka ọ fọrọ naanị elekere ole na ole ka oge ruo maka mbido ntuliaka 2019, Mahmood Yakubu bụ onyeisi INEC kwuru na e bugharịala ya bụ ntuliaka si n'abali iri na isii nke ọnwa Febrụwarị gaa abalị iri abụọ na atọ. Nke a tinyere onye ukwu na onye nta na gbagharia, ma mekwaa ka ndị mmadụ malite ikwu na ọ dị ka nrụrụaka abatala na ntuliaka ahụ. INEC adọtịala ntuliaka Nigeria Nigeria ga-ahọpụta onye ga-abụ onyeisiala taa 3. Mmeri Buhari Mgbe Muhammadu Buhari pụtara ihe dịka onye meriri okwa onyeisiala, o mere ọtụtụ mmadu ndị n'ọchị ndị n'akwa. Atiku Abubakar bụ onye PDP kwuru na nnukwu nrụrụaka dị na ya bụ ntuliaka. Atiku gbara Buhari na ndị otu ya bụ 'All Progressives Congress' (APC) akwụkwọ n'ulọikpe, mana Buhari merikwara ya ebe ahụ. Presidential election 2019: Buhari achakeela ọzọ Ụlọikpe kachasị eweliela Buharị aka elu dịka onye meriri ntuliaka 2019 4. Rochas, Nwosu na Ihedioha Uche Nwosu na Emeka Ihedioha gbara mgba ka dimkpa maka oche Govano Imo steeti, mana ọ bụ Ihedioha mechara merie. Nke a bụ n'agbanyeghi na Rochas Okorocha bụ aka na-achị Imo steeti oge ahụ dọnyeere Nwosu ukwu. Mana Rochas mechara zọta oche n'ụlọomeiwu ukwu n'agbanyeghi mgba ya na onwe ya gbara n'akụkụ nke ya maka oche ahụ. M ga-edozi ihe mebiri emebi n'Imo steeti - Emeka Ihedioha INEC eforola ntutu taa n'isi Rochas Okorocha 5. Amaechi na Wike Gọvanọ Rivas Steeti bụ Nyesom Wike na Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi gbara nnọọ mgba maka onye ga-emeri oche gọvanọ steeti ahụ. Ọ bụ ezie na Amaechi esoghi zọọ ya bụ ọkwa, mana ọ kwadoro Tonye Cole bụ onye otu ndọrọndọrọ 'Africa Progressives Congress' (APC). Nke a bụ n'ihi na INEC kụpụrụ ndi APC iso zoo ọchịchị na Rivas. Mana Wike meriri ma Amaechi ma Cole, kụọ ha abụọ ukwu n'ala. Wike awụọla onye Amaechi na-akwado n'ala 6. Mwepụta ndị isi ụlọomeiwu Ahmed Lawan Onye ọbụla chị obi n'aka oge a na-akwado ntuliaka maka ndị isi ụlọomeiwu ukwu na nke nta. Mana n'ikpeazụ, Ahmed Lawan na Femi Gbajabiamila tuuru ugo. Ike Ekweremadu so wee zọọ ya bu ọkwa, mana ọ chịtaghi aja. Ndigbo agbazị aka n'ọchịchị Naịjrịa? 7. Dino Melaye Ndị uweojii na-enyocha Dino maka ebubo gbasara ogbugbu mmadụ na ohi Dino Melaye kụrụ afọ n'ala na ndọrọndọrọ nke ndị otu PDP mere iji họputa onye ga-anọchite anya ha n'izọ ọkwa gọvanọ Kogi Steeti. Oteghi aka, ụlọikpe kagburu mmeri ya dịka onye omeiwu, ma kwuo ka e megharia ntuliaka ya. Mgbe e megharịrị ya, Melaye kụkwara afọ n'ala ọzọ wee ghọọ 'Aaron' gbara aka ala. Bayelsa-Kogi Governorship Elections: Yahaya Bello emeriela na Kogi Aga m azọta oche gọvanọ Kogi state - Dino Melaye 8. Nwụchi na mkpọrọ Sowore Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019 Ndị uweojii nzuzo bụ 'State Secret Service (SSS) nwụchiri Sowore n'ọnwa Ọgọstụ, ma tụọ ya mkpọrọ. Iwe ha bụ na Sowore chọrọ ịhazi ngaghariiwe a kpọrọ 'Revolution Now'. E mechara tọghapụ ya naanị otu ụbọchị tupu a nwụchie ya ọzọ. Sowore ka nọ na mkpọrọ ruo taa, agbanyeghi na ụlọikpe enyela iwu ugboro ugboro ka a tọhapụ ya. Ndị otu 'Revolution Now' na-achọ ndị otu ha a nwụchiri anwuchi 9. Bọjeti 2020 Onyeisiala Buhari bugaara ndị omeiwu Bọjeti 2020. Ndị omeiwu mere ngwa ngwa itule ya bụ bọjeti ma kwado ya. Buhari binyere aka na bọjeti n'abalị iri na asaa nke ọnwa Disemba. Nke a bu nke mbụ kemgbe afọ 1999 onyeisiala na-ebinye aka na bọjeti n'ọnwa Disemba nke ga-eme ka ọ malite kpọmkwem n'abalị mbụ nke Jenụwarị. Ihe dị iche na bọjeti Naịjirịa nke 2019 na nke 2020 10. Mkpọrọ Orji Uzor Kalu Ụlọikpe dị na Legọs mara OUK ikpe maka nrụrụaka ma tụọ ya nga afọ iri na abụọ. Nke a gbara ọtụtụ mmadụ gharịị n'ihi na Kalu bụ onye otu All Progressives Congress (APC) bụ Pati nọ n'ochịchị. Ngalaba mgbochi nrụrụaka bụ EFCC kwukwara na ọtụtụ ndị jibu ọkwa gọvanọ ka na-agabiga nnyocha. Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka oche Kalu dịka a tụrụ ya mkpọrọ afọ 12 Ka anyị chebiri afọ 2020 makana ọ dị ime! Onye ma nke ndọrọndọrọ ọchịchị ga-amụta? Akụkọ ndị ga-amasị gị Nigeria anaghị akwado mmegide okpukperechi - Lai Mohammed Lampard ji ọkpụ goolu abụọ maya Mourinho agba na be ya Aga m akwụ ndị ọrụ N30,000 malite n'ọnwa Jenụwari 2020 - Umahi
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ikpe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-46667790
Ikuku Ekeremesi ọ na-eku n'akụkụ gị?
N'agbanyeghi na ọtụtụ ndị mmadụ na-eti mkpụ ihe isi ike, Ekeresimesi afọ a na-akpọtụ ebe niile.
2019-12-24T14:50:53Z
Christmas: Ekeresimesi na-eku ebe niile ka ụgụrụ
Ndị gara ịdọrọ ego n'Igwe ego ATM A ghaa ọka o koro n'elu dịka ndị gara ịdoro ego juputara n'Igweego 'ATM' Ndị na-azụ ihe Ekeresimesi Ndị na-azụ ihe Ekeresimesi Ekeresimesi Ego adịghị, ego adịghị, lekwa ndị mmadụ ka ha na-azụ ọkụkọ n'ike n'ike Ekeresimesi N'agbanyeghi na ego ụgbọala site Legọs gaa ala Igbo na-ada site N9000 ruo N12000 ma dịrị gawa, taa bụ ụbọchị ụka, ọtụtụ ndị njem chere ihu n'ọwụwa anyanwụ Ekeresimesi Ọdọụgbọala na-aga ala Igbo anaghỊ ekwo etu o si ekwobu Ọgbakọ ụgbọala Ndị mmadụ ejughị n'ọdọụgbọala a etu o si adịbu Ọdọụgbọala a dị ka ọ gbara chakoo Ọ bụ oke ego ndị ụgbọala na-ana ugbua mere ka ọdọụgbọala dị ka ọ gbara chakoo? Ọkụkọ N'agbanyeghi ọnọdụ ndị mmadụ nọ, a ga-atarịrị anụ ọkụkọ
[ "Naijiria", "Nri", "Njem", "Njem nleta" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-46667279
Ị na-arụ ọrụ ndị a? Chefuo maka 'ezumike' nke ekeresimesi a
Dịka ọtụtụ ọrụ na-emechi afọ maọbụ na-ala ezumike nke Bekee kpọrọ "holiday", ọrụ ndị a na-arụrụ gawa.
2019-12-25T04:43:35Z
Christmas Message: Ị na-arụ ọrụ ndị a? Chefuo maka 'ezumike'
Ụlọ oriri na nkwari Ị nọ n'ụlọ gị ugbua enweta ezumike? Mara na enwere ndị ọrụ ha ekweghị ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Na ndị mmadụ na-ala ụlọ ekeresimesi maọbụ na ha nọ n'ụlọ maka ezumike a kpọrọ "public holiday" abụghị maka ọtụtụ n'ime ndị na-arụ ọrụ ndị a. Tupu ị gbara lawa Ekeresimesi, gụọ akụkọ a! Ikuku Ekeremesi ọ na-eku n'akụkụ gị? Social media: Chee ya echee tupu ị mee ihe isii a Ya mere, ka ị na-ekpori ndụ gị na-enwe aṅụrị, cheta na enwere ndị nọ ebe ha nọ na-eme ka ụbọchị na-aga were were na ndụ ndị mmadụ. Otiegwu a ma ama bụ Olamide chetakwara ha. Ebe o si "ka njọ" bụ na ọrụ ha enweghị nkwụsị, ọ bụ ọrụ a na-arụ ụbọchị asaa n'ime otu izu. Ị nwere ike ịlelị ha anya, mana ị ma ụdịrị uru ha bara ọkachasị n'oge ezumike a? BBC chọrọ ịkọwapụta ụfọdụ n'ime ha: 1) Ndị ọkwọụgbọala/ọgbatumtum: Kedụ ụzọ ọzọ ị ga-esi gazuo ebe niile na-agụ gị ịga maọbụrụ na ị nweghị ụgbọala? Ọ bụ ndị ọkwọụgbọala maọbụ ọgbatumtum ga-ebuga gị ebe niile ị chọrọ ịga. Ọ bụrụzịkwanụ na ha chịba ụkwụ n'ụlọ sị na ha nọkwa n'ezumike dịka ị si nọrọ, ị mara na ị ga-abụzị oji ụkwụ aga Aba. 2) Ndị ọrụ nchekwa: Ndị uweojii, ndị agha na ndị ọzọ ọrụ ha bụ ichekwa obodo kwara akpa ha lawa n'ụlọ kwuo na ha na-emechi ọrụ maka ezumike, kedụ onye ga-elekọta obodo? Ndị ọrụ nchekwa anaghị emechi makana oge niile, anya kwesịrị iru ha ala n'ihe na-aga ebe niile, ka ọgbaghara ghara ịdapụta. Ọrụ ha gụnyekwara ịhụ na ị labara n'udo, ma hụ na anya gị abụọ mechiri ọfụma ka ị na-arahụ ụra. 3) Ndị ntaakụkọ: Ọ bụrụ na ndị ntaakụkọ ghara ịrụ ọrụ, kedụ etu ị ga-esi mara ma a sị "ngwanụ gbafuonu"? Ọrụ ndị ntaakụkọ dị ezigbo mkpa makana etu ahụ ka ị ga-esi mara ihe na-eme n'akụkụ gị nakwa na mbaụwa. Ndị ntaakụkọ na-agba mbọ ịhụ na ka ị gbanyere ihe onyonyo maọbụ redio gị, na ị ga-ahụ ihe ị ga-ele maọbụ gere na ya Ebe o si kara ndị na-arụ ya mma bụ na e nwere ike irụbiri ya arụbiri, nke bụ na ị rụtụ obere, onye ọzọ arụtụkwa obere, mana akụkọ ga-agarịrị n'ihu. Ma ndị na-arụ na redio, ihe onyonyo, ndị na-ede ede, ndị na-agụ agụ, onye ọbụla na-apụta n'ọgbọ n'agbanyeghị ụbọchị ọ bụ. 4) Ndị na-arụ n'ụlọọgwụ: E kwesịrị ichetara gị uru ndị dọkịta na nọọsụ bara na ndụ mmadụ? Ọrụ ha anaghị ama mgbe bụ ụtụtụ, abalị, maọbụ ụbọchị ezumike, n'ihi na ha ga-anọ ya ma mmadụ anọ n'ogige ha maọbụ anọghị, makana anaghị amacha mgbe ihe ga-ebute mmadụ. Kedụ ebe ị ga-aga ma enwee ka ahụ si eme gị ka ị na-ekpori ndụ? 5) Ndị na-arụ n'ọdọụgbọelu: A ga-asị ndị mmadụ emela njem ụgbọelu n'ihi na "ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ezumike"? Ị mee elu mee ala, ndị mmadụ ga-emerịrị njem, mana kedụ onye ọ bụ ọrụ ya ịhụ na ị mere njem ụbọchị kwesịrị ịbụ nke ezumike? Ọdọụgbọelu na-arụgide ọrụ ma n'ụtụtụ ma n'abalị Ọ bụ ndị na-arụ ọrụ n'ọdọụgbọelu; dịka ndị ọkwọụgbọelu, ndị na-elekọta ndị mmadụ n'ime ya nke Bekee kpọrọ "air host/hostess", ndị injinia ọrụ ha bụ ilekọta ụgbọelu tupu o felie nakwa ndị ọzọ ọrụ ha bụ ịhụ na njem gị n'ụgbọelu ga-aga ọfụma. 6) Ndị na-ere nri: Eeh! N'ezie ọ na-akara ọtụtụ ndị mma isi nri ha ga-eri n'ụlọ ha, mana kedụ maka ndị na-enweghị ohere ahụ? Kedụkwanụ maka ndị na-apụ ọrirị ebe a na-ere nri dịka ụlọ oriri na nkwari na nke Bekee kpọrọ "fast food joint"? "Nri bụ ndụ", ndị na-ere nri ma nke a, ya mere ha ji azọ ndị mmadụ ndụ site n'ire nri ma n'ụbọchị ezumike o, ma n'ụbọchị nkịtị. 7) Ndị ọrụ gbatagbata: Ndị ọrụ ha bụ imenyụ ọkụ ọgbụgba, ndị ọrụ ha bụ ịzọpụta ndị mmadụ n'ihe mberede nakwa ndị ọzọ na-arụ ụdịrị ọrụ ndị a, anaghị achịba ụkwụ n'ụlọ. Ha na-aga ọrụ makana ụdịrị ọdachi a nwere ike ịdapụta. 8) Ndị nchekwa ụlọmkpọrọ: Ha laa ezumike, onye ga-echekwa ndị nọ n'ụlọmkpọrọ? Ọrụ ha bụ ịhụ na ndị a tụrụ nga agbafughi ga kpaa mkpamkpa, ya mere ha ga-anọ ya site n'ụtụtụ ruo n'abalị, ịhụ na ihe ndapụta adapụtaghị. Ka mmadụ ghara ikwu "aka m adịghị n'ihe mere". Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọ bụghi eziokwu na anyị adịghị aza oku ndị Umunze - Uweojii Ikuku Ekeremesi ọ na-eku n'akụkụ gị? Mụọ ozi na-agbapụta ndị agaghị akwụnwụ ụgwọ n'ụlọọgwụ Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Omume", "Ọrụ aka", "Ọrụ", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50703737
Akụkọ ndị bụ ọgbara Igbo gharịị na 2019
Dịka afọ 2019 na-apịachị, lekwa ụfọdụ akụkọ ndị gbara Igbo gharịị na etu esi nabata ya.
2019-12-26T04:55:39Z
2019 in summary: Akụkọ ndị bụ ụwa bịa lele na 2019
Ụkọchukwu Alph Lukau kwụ n'akụkụ akpati ozu, tụkwasị aka n'elu afọ nwoke o kwuru na ọ kpọlitere n'ozu Ụkọchukwu Alph Lukau (yi uwe na-acha anụnụ anụnụ) na-ekwu na ọ kpọlitere ozu nwoke a 2019 na-abịa na njedebe n'ike n'ike mana lee ụfọdụ akụkọ ndị Naịjirịa ọkachasị ndị Igbo agaghị echezọ echezọ. Anyị ga-malite site na nke dịka ọ chọrọ itinye ụjọ n'ime ụmụnwoke. Aka akparala onye nkuzi na-eme ka nwata akwụkwọ rachaa ya utu tupu o bufee ya Dọkịta egbuola nwaanyị otele ukwu gbalaga 1.Ile anya n'ara nwaanyị ọ na-agbati ndụ nwoke? Dịka ikuku ọkụ, o bidoro wube na ile nwaanyị anya n'ara ruo nkeji iri kwa ụbọchị nwereike idọtị ndụ nwoke dịka nchọpụta otu nwoke sayensi si mba Germany si kwuo. Mana mgbe BBC Igbo jụrụ ya ndị ọkammụta na mmekọrịta nwoke na nwaanyị, ha zara na o nweghị mgbe sayensi ji gosipụta nke a. Mana otu n'ime ha gwara anyị na onwekwara ike ịbụ eziokwu. 2. Ụkọchukwu kwuru na ọ kpọlitere mmadụ n'ọnwụ Ụkọchukwu Alph Lukau (yi uwe na-acha anụnụ anụnụ) na-ekwu na ọ kpọlitere ozu nwoke a Ị chetara mgbe otu ndị ụlọozu nọ na mba Saụt Afrịka kwuru na ha ga-akpụpụ otu nwoke kpọrọ onwe ya ụkọchukwu ụlọikpe maka ikwu na ọ kpọlitere mmadụ n'ọnwụ. Otu ihe nkiri e kesara ọfụma na soshal midia, gosiri ụkọchukwu Alph Lukau ka ọ na-agwa otu nwoke dina n'ime akpati ozu "kunie" o kuliri ka ndị mmadụ malitere iti mkpu ọṅụ. Ndị ụlọozu ahụ kwuru na a ghọgburu ha, iji mee ka ha sonye. Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ihe "ịtụ n'anya" ahụ mere n'ihu ụlọụka Lukau dị nso n'obodo Johannesburg, ebe ọtụtụ ji ya mere ihe ọchị. "Anyị ekwenyeghị na e nwere ihe ọbụla dịka ihe iribama", ka ngalaba na-ahụ maka omenala, ofufe na asụsụ a kpọrọ "(CRL Rights Commission)" gwara ndị ntaakụkọ mba Saụt Afrịka. Nwoke ahụ akpọlitere n'ọnwụ mechara nwụọ n'ihe mberede okporoụzọ ka otu izu ụka gafechara. 3.Onyonyo na-egosi onye nkuzi Unilag na-achọ ị dina ụmụakwụkwọ nwaanyị Ugboro ugboro ka ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị na mahadum dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka na-ekwu na ndi nkuzi ha na-enye ha nsogbu iji dinaa ha. Mana mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị ekwetacha ihe ha na-ekwu. Ihe onyonyo a BBC setere gbara nke a n'anwụ. 4. Ihụtụla Nwoke maọbụ nwaanyị nwere ọtụ na amụ n'ahụ ya? Mgbe ọbụla ị nụrụ na mmadụ abụghị nwoke ọ bụghị nwaanyị, kedụ ihe na-agba gị n'uche? Nke a bụ akụkọ banyere ndị Naịjirịa abụọ James Johnson na Mystique Evolving bu ikpu na amụ pụta ụwa. Mmadụ abụọ ndị a kọrọ akụkọ ha nakwa ihe ndị ha na-agabiga na ndụ n'ihi ọnọdụ a. 5. Enyi na enyi lụrụ ọgụ ka ụkọchukwu ha tiwara ha akụ oyibo nsugbe A na-ebokarị ụfọdụ ndị ụkọchukwu Naịjirịa maka amụma ụgha ha na-ebu Ị na-agakwa n'ihu ụfọdụ ụkọchụkwụ kpachapụ anya. I chetara ka ụkọchukwu si gwacha ọyị abụọ okwu ma bo otu n'ime ha na aka ya dị n'ime ihe ọjọ na-eme nke ọzọ. N'otu ntabi anya ha abụọ bido lụwa ọgụ nke mere ka ndị mmadụ tiwe "Pamela Why" n'elu soshal midia. Nke a mere na mba Saụt Afịrịka. 5. Nwaanyị lụrụ nwaanyị I chetara mgbe anyị wetere ụnu akụkọ Felicia Orji lụtara nwa ya nwoke nwụrụ anwụ nwaanyị. O kwuru na ọ bụ makana nwa ya nwoke ahụ amụtaghị nwa tupu ọ nwụọ kpatara nke a. Gerekwa ya ọzọ ka ị mata ka nwaanyị a alụtara alụta si mụta ụmụ ndị ọmụgoro Felicia. 5.I mana ka esi akpachapụrụ ọtụ anya? Nke a bụ akụkọ bara nnukwu uru mana ndị Igbo kụjara akụja na BBC nwereike iwepụtali ntuziaka gbasara akụkụ ahụ a. Ha nabatara ya agbanyeghị na ọ gbara ha agba na ntị. Gụọ ya n'uju ebe a Ihe 5 ndị nwere ọtụ kwesiri ịma 6. A ga-enyewe ụmụnwoke ọgwụ mgbochi nwa - Ndị dọkinta Ndị dọkịnta n'India na-akọwa na ha arụpụtala ọgwụ ga-eme ka nwoke ghara ịtụwa nwaanyị ime mgbe ọ na-achọghị. Ha sị na ha na-enyochala ọgwụ a ma chọpụta na ọ na-arụ ọrụ ruo pasenti 97.3 ma kwukwa na ọ naghị enye nsogbu ọbụla n'ahụ. Mana n'otu ntabi anya , ha pụtara kwukwa na ha akwụsịtụla igba ọgwụ ahụ makana ya bụ ọgwụ bidoro tiwasasia utu ụmụnwoke. 7.A ka na-ekwu nke bere nụ, ọzọ bekwasi ya Ọtụtụ mmadụ hụchara etu enwereike isi lekọta ọtụ nwaanyị wee rịọ ka akuzie maka amụ nwoke. Mana mgbe ya bụ akụkọ pụtachara, chọọchị gbasara! Lee ya ebe a. Ihe ise i kwesiri ịma maka amụ 8. Nwaanyị siri ma rie nwa ya Akụkọ si mba Tanzania pụta kwuru na ndị uweojii mba ahụ anwụchiela nwaanyị na di ya maka ịgba ha ajụjụọnụ maka ihe mere nwa ha nwaanyị. Ha na-enyocha nwaanyị ahụ maka ebubo igbu, sie ma rie nwa ya. Onye ma etu afọ 2020 ga-adị? Arọ ọhụrụ ọma ooo!
[ "Naijiria", "Ahụike", "Ahụike ụmụnwanyị", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50920134
Southampton akụọla Chelsea ihe Anthony Joshua kụrụ Ruiz
Southampton ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata gbarie 'Stamford Bridge' n'ụbọchị.
2019-12-26T16:53:42Z
Boxing Day: Southampton akụọla Chelsea ihe Anthony Joshua kụrụ Ruiz
Southampton meriri Chelsea 0-2 ụbọchị 'Boxing Day' Taa bụ 'boxing day' adịghị ndị Chelsea mma n'ahụ dịka ndị Southampton kụwara ha anya n'azụ owere ha. Ndị Southampton ji ọkpụ goolu abụọ gbarie 'Stamford Bridge', gbanye ndị Chelsea ose n'anya. Bournemouth akụnyela Chelsea ikputu ọnụ Man Utd ejirila Chelsea gbụchachaa ọnụ gbụfuo Nwafọ Naịjirịa bụ Michael Obafemi bụ onye buru ụzọ gbakaa neetị na nkeji 31. Obafemi, onye gbara naanị afọ 19 bụ mba Ireland ka ọ na-agbara. Na nkeji 73, Nathan Redmond mezuru ya abụọ wee mee ndị Chelsea otiwere anya ahụ ụzọ. N'aka nke ọzọ, Mikel Arteta malitere ije ya dịka onye nkuzi ndị Arsenal taa, mana o nwetaghị mmeri. Arsenal na ndị Bournemouth gbara onye lawa onye lawa. Dan Gosling nke Bournemouth nyere goolu na nkeji 35, mana Pierre Emerick Aubameyang sara ya na nkeji 73. Arteta ga-eji nke a mata na ihe chere ya n'ihu n'otu egwuregwu Arsenal abụghị ọgụ nne na-agbara nwa ya. Manchester United akụpịala ndị Newcastle Marcus Rashford achakeela nnọọ ka ọkụ Ọkpụ goolu anọ asatara otu ka ndị Manchester United ji tie ndị Newcastle mmọnwụ. Marcus Rashford, Mason Greenwood na Anthony Martial nyere goolu anọ ahụ. Martial nyere goolu abụọ ebe Matty Longstaff nyetaara ndị Newcastle otu goolu. Paul Pogba so gbaa bọọlụ nke taa Ihe kacha tọọ ndị Man Utd ụtọ n'egwuregwu nke taa bụ na Paul Pogba alọghachila. Pogba agbabeghi bọọlụ ogologo oge n'ihi ahụ o merụrụ. Mana Carlo Ancelloti ji mmeri wee malite ọchịchị ya n'Everton. Everton ji otu ọkpụ goolu merie Burnley. Crystal Palace jikwa ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie West Ham, ebe Aston Villa meriri Norwich 1-0. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Kedụ ebe 'Boxing Day' si bido? Akụkọ ndị bụ ọgbara Igbo gharịị na 2019 Kpọwanụ m 'Baba go slow', a ga m arụ ọrụ m dịka onyeisiala - Buhari Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Chelsea", "Egwuruegwu", "Manchester United", "Bọọlụ", "Arsenal" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50919804
Amụma e buru na 2019: Ndị mezuru na ndị gbara ụka
Lee ndị mere na ndị emezughị n'ụfọdụ amụma ndị ụkọchukwu mara banyere afọ 2019.
2019-12-26T18:09:19Z
2019 Prophecies: Amụma e buru na 2019, ndị mezuru na ndị gbara ụka
Fada Mbaka na Onye Amụma Emmanuel Omale Dịka afọ 2019 na-abịa na njedebe, BBC Igbo lebara anya n'ụfọdụ amụma ndị ụkọchukwu mara banyere ihe ndị ga-emenụ. Nnyocha anyị gosiri na ụfọdụ mere , ebe ụfọdụ ghọrọ ka nri gbara ụka n'ihi na ha emezughị. Ọchịchi Buhari dị mma- Mbaka 'Jogging' ka ndị ụkọchukwu mere n'Enugu - Mbaka 1. Buhari ga-emeri na ntuliaka 2019- Mbaka, Omale Onye Amuma Emmanuel Omale nke Divine Hand of God Prophetic Ministry dị na Abuja buru amụma na Onyeisiala Muhammadụu Buhari ga-emeri ntuliaka 2019. Fada Ejike Mbaka bụ onye ndu isi otu Adoration Ministry, Enugwu, kwuru na ya amaghị onye ga-emeri na ntuliaka 2019 mana na Atiku abughị ya bụ "onye nzọpụta Naijiria." Amụma ahụ mezuru dịka Buhari meriri Atiku na ntuliaka nke e mere n'ọnwa Febuwari afọ afọ 2019. 2. Atiku tinye uchu n'Ugwu Naijiria- Suleiman Johnson Suleiman nke ụlọụka 'Omega Fire Ministries International' nọrọ n'amụma nke ya dọọ Abubakar Atiku nke PDP, onye ya na Buhari zọkọrọ ọkwa na ntuliaka ahụ, aka na ntị ka o tinye uchu karịa na inweta nkwado ndị ugwu na ntuliaka 2019. Nke a mezuru n'ihi na Atiku nwetara ezigbo nkwado na Ndịda Anyanwu Naijiria ma gbaa ọnyụpa n'Ugwu Naijiria. 3. A ga-anwụchi onye zọrọ ọkwa onyeisiala Suleiman makwara amụma na a ga-anwụchi otu onye zọrọla ọkwa onyeisiala. Nke a mezuru n'ihi na ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS nwuchiri Omoyele Sowore nke zọrọ ọkwa onyeisiala na Ntuliaka 2019 n'aha AAC maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmenti tụnye ya na nga ọnwa anọ. 4. Otu onye chịbụrụ gọvanọ ga aga nga- Omale Omale bukwara amụma na otu aka chiburu otu steeti ga-aga mkpọrọ. Nke mezuru dịka Orji Uzor Kalu chiburu Abia steeti nọ n'ụlọ mkpọrọ ugbua dịka a mara ya ikpe imefu ego ndị Abia. Orji Uzo Kalu aka chịburu Abia Steeti Amụma ndị emezughị; 5.Ntọ nnukwu ọgaranya si Ọwụwa Anyanwụ na-azụ ahịa mmanu Omale kwuru na a ga-akpa nkata igbu maọbụ ịtọrọ otu onye nnukwu mmadụ si Ọwụwa Anyanwụ nọ n'ahịa mmanu nke ga-ebute ọgbaghara a ga-eji gbaa ahịa a ma ama ọkụ. Ahịa Onicha na Balogun dị na Legọs gbara ọkụ mana o nweghị ka o siri metụta ọgaranya Igbo ọbụla. 6. Ndịagha ga-enupu isi- Ayodele Primate Elijah Ayodele bụ onye ndu INRI Evangelical Church Primate Elijah Ayodele nke INRI Evangelical Church mara amụma na ndị agha Naijiria ga-enupu isi nye ndị isi ha. Nke a emezughị, mana ihe o kwuru na ihe ga-esiwanye ike mezuru dịka ihe ịda oke ọnụahịa na-aga n'ihu. 7. Atiku ga-eweghara ọchịchị n'aka Buhari- Olagunju Wale Olagunju, nke ụlọụka 'Divine Seed of God Chapel Ministries', Sasa,Ibadan mmara amụma na Chineke ga-anara Buhari ọchịchị nyefe Atiku n'aka n'afọ 2019. Nke a emezughị. Buhari ka nọ n'oche ya. Naịjiria bụ ala ọtụtụ ndị nọ na ya ejighị okpukperechi na okwu sị n'ọnụ ndị ndu ha egwu egwu, n'agbagheghị mpụtara okwu ndị ahụ. Akụkọ ga-amasị gị: Ọ bụ iwe ọkụ tinyere m n'ọnwụnwa a - Nwaanyị pịara nwaodibọ ya n'ala Kedụ ebe 'Boxing Day' si bido?
[ "Enugu Steeti", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Enugwu", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50932016
Aka ndị uweojii akparala ndị ohi wakporo ụlọakụ n'Abuja
Ndị uweojii gbagburu otu onye ma nwụchie mmadụ anọ n'ime ndị ekperima ahụ.
2019-12-28T11:22:51Z
Abuja Bank Robbery: Aka ndị uweojii akparala ndị ohi wakporo ụlọakụ n'Abuja
Ndị uweojii Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa anwụchiela ndị ohi mmadụ anọ wakporo otu ụlọakụ n'Abuja. Ha gbagbukwara otu onye ọzọ n'ime ndị oji egbe ezu ahụ. Ndị ojiegbeezu awakpoola ụlọakụ, gbagbuo otu onyeọrụụ Ndị uweojii na-achọ nwokorobia tọgburu enyi ya nwanyị n'ụlọoriri na Port Harcourt Ndị ekperima ahụ wakporo ya bụ ụlọakụ dị na Mpape, Abuja, n'ụtụtụ ụbọchị Satọdee. Mana oteghi aka ha banyechara n'ime ya, ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii na ndị agha gbara ya bụ ụlọakụ gburugburu. Nke a mere ka ndị ohi ahụ tọkịrị n'ime ụlọakụ ahụ maka na jewe ejewe adịghịzị mma, lawa alawa adịghị mma. Otu onye n'ime ndị omekome ahụ chọrọ isi azụ owere mịpụ, mana ndị uweojii nwụchiri ya otu aka ahụ. Mana ka nwa oge gachara ndị uweojii nwụchiri ndị ekperima ahụ niile. Tinyere otu n'ime ha onye mgbọ tụrụ o wee nwụọ. Aka akparala onye uweojii ekperima Aka ndị uweojii akparala ofu onye otu ha ji egbe gbagbuo otu nwata nwaokorobịa na mpaghara Legọs Aịland ụbọchị Fraịde. Onye uweojii a aha ya bụ Lukmon Akanbi na nwaokorobịa aha ya bụ Ramon Adeniyi nwere obere nghọtahie o wee mịrị egbe gbatuo ya. Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs kwuru na e kpeela Akanbi ikpe imeụlọ dịka iwu ndị uweojii sị dị, wee chụọ ya n'ọrụ. Ugbua, a hafeela ya n'aka ndị ngalaba na-enyocha mpụ bụ 'State Criminal Investigation Department' ka ha kpụpụ ya ụlọ ikpe. Ndị oyi gewu akpaala arụ na Somalia Ọtụtụ mmadụ nwụrụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ mgbe ndị oyi egwu tụrụ ogbunigwe na Somalịa n'ụbọchị Satọdee. Ogbunigwe e tinyere n'ụgbọala agbagbuola mmadụ iri asaa na isii na mba Somalia. Ndị ntaakụkọ ụfọdụ na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ eruola iri itoolu. A na-ele anya na ọnụọgụgụ a ka ga-agbago. Amatabeghị ndị tụrụ ya bụ ogbunigwe mana ndị otu oyi egwu bụ al-Shabab na-ebuso Somalia agha kwa mgbe kwa mgbe. Ndị na-eyi ndụ egwu agaghị emeri anyị - Buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ogbugbu ndị otu ISWAP gburu dimkpa iri bụ ndị ụka kristi n'ihe onyonyo iji bọ ọbọ onyeisi ha e gburu na mba Syria. Buhari kwuputara n'akara soshal midia ya na ọnwụ ndị ahụ aka ha dị ọcha wutere ya ma tụkwaa ya n'anya. O kwukwara sị na onye ọbụla kpọrọ "Allahu Akbar" na egbu mmadụ abụghị onye alakụba n'eziokwu. 'Di m na ụmụ m ma egwu mmiri' Nwunye ụkọchukwu ụlọụka Redeem nwụrụ n'ọdọ mmiri na-eti mkpu na aka enwe dị na ofe. Gabriel Diya na ụmụ ya abụọ nwụrụ ebe ha gara ezumike na mba Spen mana nwunye na-akọwa na ọ bụghị mmiri riri ha n'ihi na ha atọ ma egwu mmiri ọfụma ọfụma. Bọjetị Enugwu Steeti Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi ebinyela aka n'akwụkwọ atụmatụ mkpata na mmefu ego nke steeti ahụ maka afọ 2020. Ugwuanyị mapụtara narị ijeri naịra 169 na ụma (N169.5 billion) dịka ego a ga-eji rụọ ọrụ na steeti ahụ n'afọ na-abịa abịa. N'ime ego a, otu narị ijeri naịra na ụma (100.7 billion) bụ nke a ga-eji arụpụta ọrụ gbara ọkpụrụkpụ nke a ga-ahụ anya. Ijeri naịra iri isii na asatọ na ụma (N68.7) billion bụ nke a ga-eji gboo mkpa ndị ọzọ dịka ịkwụ ndịọrụ ụgwọ dgz. EPL Clavert-Lewin na-ekele onye nkuzi ya bụ Carlo Ancelloti Calvert Lewin nyere goolu abụọ nke ndị Everton ji weee merie ndị Newcastle n'asọmpị EPL ụbọchị Satọdee. Brighton merikwara Bournemouth 2-0, Watford apịa Aston Villa 3-0 ebe Southampton na Crustal Palace nyere onwe ha otu goolu otu goolu. Manchester United ga-ezute ndị Burnley, Tottenham na Norwich ga-achịpụ ya, ebe ndị Leicester na-ezute ndị West Ham ugbua. Kedụ onye obi na-asọ rịkpọ? Ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Peter Utaka ekwuola na obi na-eme ya pọlina pọlịna dịka ọ na-akwado ịsonye otu Kyoto Sanga nke Japan. Utaka dị afọ iri atọ na abụọ agbarala otu dị icheiche na Belgium Denmark nakwa China bọọlụ mbụ. Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Enugu Steeti", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "National security" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50941364
Chelsea agbajiela Arsenal aka napụ ha nri n'ọnụ
Egwu dagharịri n'ọkara nke abụọ ka Chelsea ji iwe sị ndị na-akwa ha ọbịa na ha abịaghị ka a gbaa ha nkiri.
2019-12-29T16:07:23Z
Arsenal vs Chelsea: Chelsea agbajiela Arsenal aka napụ ha nri n'ọnụ
Chelsea na Arsenal Chelsea ekweghi Arsenal zọọ ha mpịtị mpị ka ha zutere n'ọgbọegwuregwu Emirates. Goolu Tammy Abraham nyere na nkeji 87 na nke Jorginho nyere na nkeji 83 zuru iji tinye Arsenal n'ọnọdụ akwa arịrị na be ha. N'agbanyeghi na Pierre-Emerick Aubameyang nyerela Arsenal goolu na nkeji 13 e ji bido bọọlụ, o zughi ịkpọ ndị Chelsea ntu n'obi. Nkata ekpudola Arsenal Arachaala Arsenal ka ofe nkupu Leicester aṅụọla Arsenal ka 'akpụrụ achia' Ka a batara ọkara nke Abụọ, ndị Chelsea gara n'ihu ka ebule e tinyere mma n'olu, wee jiri ajụ ọnwụ gbanye Arsenal goolu abụọ iji wee naghara ha pọịntị atọ. Ha ji mmeri a wee sị Mikel Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ ma bụrụ onye nchịkọta ọhụrụ ha 'nnọọ'. Ka ọ dị ugbua, Chelsea ji pọịntị 35 ka nọ n'ogogo anọ na tebulu Premier League, ebe Arsenal ji pọịntị 24 nọ n'ogogo 12. Akụkọ ga-amasị gị: Uche Nwosu: 'Ọ gara nlegharị anya na AA ma laghachite APC '- FCC Jones Mwakpo Ekweremadu, ọchụchụ Tacha, ọbịbịa Cardi B na ihe ndị ọzọ ị gaghị echefu maka afọ 2019 Tyson Fury na Deontay Wilder ekwetela izute onwe ha ọzọ Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Chelsea", "Egwuruegwu", "Premier League", "Bọọlụ", "Arsenal" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50948572
'Alaghị m obodo n'ekeresimesi a n’ihi na ego adịghị n’obodo'
Gọọmentị Naịjirịa nyere ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba 2019 dịka ụbọchị ikpeazụ a ga-amalite ịkwụ ụgwọ opekatampe.
2019-12-30T14:59:09Z
Ụgwọ opekatampe nyere ndị mmadụ olileanya mana olileanya a tipiara etipia - Onye ọrụ Enugwu steeti
Ndị chọrọ ụgwọ opekatampe Ụbọchi 31 nke Disemba 2019 bụ ụbọchị ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ na Naijirịa bụ 'Nigerian Labour Congress' (NLC) nyedebere steeti niile na Naijirịa ka ha kwụwa ụgwọ opekatampe. Mana dịka ụbọchị ahụ na-erute nso, Enugwu steeti na Anambra steeti so na ndị ebidobeghị ịkwụ ya. Okwu 'Minimum wage' a ga-ebi taa? Minimum wage: Gọọmentị ga-akwụrịrị anyị N30,000 N'otu aka ahụ, ka ndị ọrụ steeti ahụ sị na ha ji nwayọ eme emume ekeresimesi nke afọ a makana ego adịghị. Onye nkuzi na mahadum Enwugwu steeti bụ Mazi Nnamdi Okenwa, kwuru na o cheghị na e nwere steeti na Naijirịa mezuru ihe gbasara ụgwọ opekatampe nke ga-erute ndị ọrụ gọọmentị ruo agba nke iri na isii. Gọọmentị Abia steeti jị ndị ABSU ụgwọ enyemaka O nweghi ngagharịiwe ndị ọrụ chọrọ ime n'Abia State - Obigwe O kwukwara na n'agbanyeghi na gọọmentị Enugwu steeti kwụrụ ụgwọ ọnwa nke ọnwa Disemba ma tụkwasịkwa ya ọnwa ọzọ nke e ji 'ụgwọ ọnwa iri na atọ' mara, na ha ekwubeghị okwu ịkwụ ụgwọ opekatampe. Minimum Wage: Etu ngagharịiwe ndị NLC si aga 'Anyị eriwela N30,000 ụgwọ opekata mpe' - Ndị ọrụ Gọọmentị Ọ kọwara na gọọmentị etiti emebeghị ihe ha kwesịrị ime iji hụ na gọọmentị steeti ahụ ga-akwụnwu ya bụ ụgwọ. Ọ kọwakwara na a kwụọ ụgwọ opekatampe a, na o nwereike ime ka ego ihe dị n'ahịa laa elu nke ndị bekee na-akpọ 'Inflation'. Ụgwọ Opekatampe: 'Anyị ekweghị na ndọghachiazụ' 'Abụbọ ọrụ ga-eso akwụghị ụgwọ opekatampe' Nnamdi Okenwa kwukwara na ya alaghị obodo maka ekeresimesi n'ihi na ego adịghị. O kwuru na ụgwọ opekatampe nyere ndị mmadụ olileanya kama olileanya a tipịara etipịa. Ihe ndị 'NLC' Anambara nwere ikwu Mgbe BBC kpọrọ onyeisioche ndị ngalaba 'NLC' nke Anambara steeti bụ Jerry Nnubia, o kwuru na mgbe ha na gọọmentị Anambara zutere, na ha anabataghị ihe gọọmentị kwuru maka ụgwọ opekatampe. Nnubia sị na ha na-eche ka gọọmentị zaa ha dịka ha siri kwuo. O kwukwara na ha ga-akpọtụrụ gọọmentị taa bụ ụbọchi 30 nke ọnwa Disemba 2019, ma ọ bụru na gọọmentị emeghị ihe ha kwesịrị ime na ha ga-ezute were kpebie ihe ha ga-eme echi bụ ụbọchị (31 nke Disemba) ikpeazụ ha nyere gọọmentị ikpebi ịkwụ ụgwọ opekatampe. Ihe ndị 'NLC' nke Enugwu steeti nwere ikwu Onyeisi ngalaba ndị NLC nke Enwugwu steeti bụ Nwobodo Virginus, kwuru na a ga-enwe ọgbakọ ngalaba e hiwere maka ịkwụ ụgwọ opekatampe n'Enugwu steeti nke gụnyere ndị ọrụ gọọmentị na ndị otu NLC na mgbede Disemba 30, 2019. O kwuru na ọ bụ mgbe ha nwechara ọgbakọ a ka ndị otu NLC ga-ama ihe ha ga-eme. Nwobodo sị na ọ nọghị na ngalaba a ehibere maka ikwụ ụgwọ opekatampe a. Ọnọdụ gọọmentị Anambara steeti maka ịkwụ ụgwọ opekatampe Onye kwuchitere gọọmentị Anambara steeti bụ Don Adinuba, gwara ndị ntaakụkọ BBC na gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano, gwara ndị ọrụ gọomentị steeti ya mgbe ha na-eme emume maka ncheta ndị ọrụ gọọmentị nke ha mere n'ụbọchi 16 nke Disemba 2019, na gọọmentị ga-akwụ ụgwọ opekatampe. Adinuba kwuru na gọomentị Anambara steeti ga-akwụ ụgwọ opekatampe nke N30,000 site n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2020. O kwukwara sị "gọomentị ga-ebuli ụgwọ mmadụ niile na-arụrụ ha ọrụ" . O kwuru na gọomentị Anambara dị njikere ilekọta ndị ọrụ ha dịka ha kwụrụ ha ụgwọ n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Disemba, ma bunye ndị ọrụ ha niile otu akpa osikapa.
[ "Naijiria", "Enugu Steeti", "Akụ na ụba", "Ọrụ", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50950623
Gịnị mere ụmụnwaanyị ji amụju ụlọ ebe ha na-achọ nwa nwoke?
Ụmụnwaanyị na-ekwu ihe mere ha ji amụju ụlọ ebe ha na-achọ otu ụdịrị nwa.
2019-12-30T16:54:12Z
Maternal Mortality: Uche Jombo na ụmụnwaanyị ndị ọzọ kwuru ihe mere ha agaghị amụju ụlọ
Nwaanyị ku nwa nwoke Ụfọdụ ndị ọkachamara na-eche na ịkwụsị atụmaatụ ebe ụmụnwaanyị na-achọrịrị ka ha mụta nwa nwoke nwereike belata ụmụnwaanyị ịnwụ ebe ha na-amụ nwa. Uche Jombo kwuru na ọ dịghị ka ụmụnwaanyị na-achịpụta ụmụ iri na abụọ maọbụ itoolu dịka nne ya si mee. Ụmụ ole ka nne na nna kwesịrị ịmụ? E jirila akpanwa onye nwụrụ anwụ mụta nwa dị ndụ Gịnị kpatara ndigbo ji kwụsị ịgụ ụmụ ha ụfọdụ aha? Jombo kwuru na ịmụta nwa na-ara ya ahụ; na afọ ime ya pụrụ ugboro atọ. Ibukun Ogu ji ụmụ atọ kwuru na o bu ụzọ mụta ụmụnwaanyị abuọ tupu ọ mụta otu nwoke mezuru ha ụmụ atọ. Mana o kwuru na ya na di ya kwetara ịmụta ụmụ abụọ sọsọ mgbe ha lụchara di na nwunye. Otu nwaanyị na-achọghị ka a mata aha ya kwuru na ya mụrụ ụmụ anọ ebe ọ na-achọ ịmụta nwa nwaanyị. O kwuru na o ji ịwa afọ mụọ ha niile nke mere ka di ya were ụjọ sị ya amụzịla ka ọ mụchara nke atọ bụkwa nwoke, mana o siri ọnwụ mụọ nke anọ mechara bụrụ nwa nwaanyị ọ na-achọ kamgbe. Ihembosi dị afọ iri atọ na asaa mụrụ nke mbụ, ọ bụrụ nwoke, nke abụọ so ya bụrụ ejima nwoke abụọ, nke anọ abụrụzịa nwaanyị ọ na-achọ. Mana otu nwaanyị ahụ mechara nwụọ. Kedụ ihe mere ụfọdụ ụmụnwaanyị ji achọkarị ka hamụtarịrị nwoke maọbụ nwaanyị? N'agbanyeghị ihe ọdachi na-adakwasị ụmụnwaanyị na-agba mbọ ịmụta nwoke maọbụ nwaanyị mgbe ụfọdụ, ọtụtụ achọghị ikwụsị ya bụ atụmatụ. Ihe mere Chinenye ji ụmụnwoke atọ ji chọọ ịmụtarịrị nwa nwaaanyị Ọ chọrọ ka ndị ọgọ bịa be ya (ịnata ụgwọ isi nwaanyị) Ọ chọrọ ịmụta onye yiri ya kpọmkwem Ngwakọ amaka - A mụọ nwoke, a mụọ nwaanyị Ọ chọrọ inwe ohere ịga ọmụgwọ Gịnị mere e ji achọkarị nwa nwoke? Chinedu Balogun kwuru na otu n'ime ha bụ oke ịcha ọkụ ụmụ ụwa na-enye di na nwunye. Ihe ndị ọzọ e ji achọ nwa nwoke gụnyere: Ndị na-achọghị ka aha ezinaụlọ ha 'fuo', maka a na-asị na ezinaụlọ amụtaghị nwa nwoke, na ama ha eshiela. Nwaanyị mụrụ nwa nwoke na-ahụ ya na o chizuola, na ọ ga-ekwunwu okwu ebe ndị ọzọ na-ekwu. Nwa nwoke na-azọtanwu akụnaụba dị n'ezinaụlọ ha karịa nwaanyị a ga-alụpụ alụpụ. Ọtụtụ agbụrụ na-aka akwanyere nwa nwoke ugwu karịa nke nwaanyị. Ngalaba European Union na United Nations a kpọrọ "Spotlight Initiative" na-ekwu na atụmatụ ịmụtarịrị nwa nwoke ebutela mmegide dị iche iche nye ọtụtụ ụmụnwaanyị na Naịjirịa. Akụkọ ndị ga-amasị gị 'Alaghị m obodo n'ekeresimesi a n’ihi na ego adịghị n’obodo' Ndị uweojii anwuchiela otu nwoke ji enyi ya nwaanyị gwọọ ọgwụ ego Chelsea agbajiela Arsenal aka napụ ha nri n'ọnụ Akụkọ ndị bụ ọgbara Igbo gharịị na 2019 Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Ezinụlọ", "Naijiria", "Ụmụaka", "Afịrịka", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50873637
Gọọmenti Kano akwụsịtụla iwu machiri nwoke na nwaanyị ịnọkọ na keke
Ndị mmadụ bi na Kano ekwuola etu iwu ọhụrụ gbasara nwoke na nwaanyị ịnọkọ na keke si metụta ha.
2019-12-31T12:01:59Z
Kano Hisbah: Ganduje kwụsịtụla iwu machiri nwoke na nwaanyị ịnọkọ na keke
Onye keke Gọọmenti Kano steeti aracharala ihe ha gbọpụrụ dịka ha kwusịtụrụ iwu machiri nwoke na nwaanyị ibanye otu keke. Onyeisi otu ndị uweojii Sharia na steeti ahụ bụ Sheikh Harun Ibn-Sina onye kwupụtara nke a kwuru na ọ bụ iji nye ohere ka a kpa ya akpaa tupu e tinye ya n'ọrụ. Cheta na ọtụtụ ụmụ Naijiria katọrọ atụmatụ ahụ oge e kwupụtaburu ya. Lee ihe ụfọdụ kwuru na Facebook BBC Igbo maka ya bụ atụmatụ: Kano Hisbah: 'Iwu keke ọhụrụ naghara m ịga ọrụ n'oge' Otụtụ ndị bi na Kano jikwara eze kpee ekwere dịka iwu ahụ pụtara ihe. Elizabeth Sabis bi na Kano akwaala arịrị gbasara etu iwu ọhụrụ ewebatara na Kano si emetụta ya. Sabis gwara BBC Igbo na iwu a mere ya ka ọ ghara ịga ọrụ n'oge n'ụtụtụ n'ihi na ndị Keke bu nwoke ekweghị akwụsịrị ya. Anambra steeti amachiela keke 'Ọ bụrụ na ọkụ na akụrụngwa dị anyị gaara ime karịa' O kwuru sị "e chere m ọtụtụ oge tupu m hụ keke ebụghị nwoke m bara nke kpatara na m erughi ụlọọrụ m n'oge" Cheta na otu Hisbah na Kano bụ ndị na-elekọta iwu Sharia na steeti ahụ ga-ebido ịda onye keke bukọrọ nwoke na nwaanyị otu mgbe. Ha kọwara na iwu a adịla kemgbe afọ 14 gara aga mana ugbua ka ha ga-etinye anya na ya ọfụma. Keke ga-ebidozi gbawa ruo elekere itoolu n'Aba na Umuahia Ihe ndị ha ga-ada ndị mmadụ bụ: ị jichi keke onye ahụ rue ọnwa isii, ị da ya nha naịra puku ise nakwa ụtali iri. Ndị mmadụ dịka Edward Onoride katọrọ emume a na-ajụ ma Hisbah a ga-egbochi nwoke na nwaanyị ịbanye otu ụgbọelu? Kano steeti malitere ị so iwu Sharia kemgbe afọ 2001.
[ "Islam", "Naijiria", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50941370
Ị nweghi ike ichefu ihe ndị a mere n'afọ 2019
Afọ 2019 kpọtụrụ akpọtụ, zụọ azụọ. Lee ihe ndị ị ga-eji cheta maka afọ a.
2019-12-31T16:16:22Z
New Year's Eve: Ị nweghi ike ichefu ihe ndị a mere n'afọ 2019
[ "Omume", "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50950626
Ọ bụ oke Ndigbo iwepụta onyeisiala n'afọ 2023 - Nnia Nwodo
Nnia Nwodo bụ onyeisi ndị Ohaneze Ndigbo ekwuola sị nye ndị Igbo oke ruru ha n'afọ 2023.
2019-12-31T17:18:10Z
Ohanaeze Ndigbo: Ọ bụ oke Ọwụwa-anyanwụ iwepụta onyeisiala n'afọ 2023 - Nnia Nwodo
Nnia Nwodo Ohaneze Ndigbo ekwuola na ọ bụ oke ndị Ọwụwa Anyanwụ iwepụta onye ga-abụ onyeisiala n'afọ 2023. Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo kwuru nke a ka e wepụtaara ọha akwụkwọ maka ndụ Igwe Nnewi bụ Igwe Kenneth Orizu na Nnewi na nso nso. Nwodo sị na e meghị etu a bụ igosi ndị Igbo na ha esonghizi n'ihe a na-eme n'ala Naijiria. Napụnụ nwa onyeisiala akụnaụba ya - Ụlọikpe Ụlọikpe dị na mba Angola enyela iwu ka a nakọrọ Isabel Dos Santos bụ nwa nwaanyị Jose Eduardo Dos Santos onye bụbụ onyeisiala, ọbaego nakwa akụ ndị ọzọ ọ kpakọrọ. Isabel bụ onye a na-agụbu dịka 'nwaanyị kacha nwee ego na mpaghara Afrịka', bụ onye a na-ebo ebubo iso ndị kpakọrọ akụnaụba obodo ebe o ruru otu ijeri dọla. E bokwara ya ebubo ịnwa izubanye nde Yuro iri na mba Rọshịa. Ebubo a na-abịa dịka onyeisiala mba ahụ bụ Joao Lourenço na-anwa ịnapụta ego ruru otu nde dọla ọ sị na Isabel na ndị otu ji. Oge ọbụla ka ọ na-agọrọ ụkwụ na aka ya, sị na ọ maghị maka ebubo ndị a na-ebo ya ọkachasị oge nna ya nọ n'ọchịchị. Ọgụ ọ chara n'Ịran? Ndị na-eme ngagharịiwe na mba Ịran esunyela ụlọọrụnnọchiteanya ndị mba Amerịka ọkụ maka iwe ogbunigwe si n'ikuku Amerịka tụpụrụ. Ha gara n'ihu kwuo na ha chọrọ ka e mechie ụlọọrụ ahụ. Rooney ọ ka na-agba bọọlụ? Ikpeazụ Wayne Rooney gbara bọolụ bụ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọktoba 2019 oge ọ ka nọ DC United A na-atụ anya na deede Wayne Rooney dị afọ iri atọ na anọ ugbua, ga-agbara Derby County bọọlụ mgbe ha na Barnsley ga-ezute na Championship. Cheta na Rooney binyere aka n'akwụkwọ ịgbara ha bọọlụ ma na-etinye ọnụ na nchịkwa kemgbe Ọgọstụ. Iji 'paracetamol' esi anụ kanda nwere ike igbu mmadụ - NAFDAC Anụ kanda Nke na-ewu ugbua bụ na ụfọdụ ndị n'esi nri ahịa na-etinyezi ọgwụ paracetamọl n'anụ. Ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control' (Nafdac) bụ ndị kwuru nke a. Nafdac ebuliela mmachi Emzor na ndị ọzọ Sniper: Nafdac amachiela mbugharị maọbụ ntụbata ọgwụ kemịkal ugbo Ha kwuru na ndị mmadụ na-eme nke a ka anụ kanda ha na-esi ghee ngwa ngwa. Mana NAFDAC na-adọ aka na ntị ka ndị mmadụ hie asaa n'anya. Ha kọwara na Paracetamol na-akụrị umeji nakwa ngụngụ mmadụ ma e sie ya n'ọkụ. Lee ụzọ ị ga-eji sie kanda gị ka o ghee n'oge: Were osiite pụrụ iche a kpọrọ 'pressure cooker' sie ya. Banye ya na 'vinegar' maọbụ na mmanya wine nwa mgbe nta tupu ị malite isi ya. Banye ya na mmiri oroma, ọkwụrụ arọ (paw-paw), akwụ olu (pineapple), ube bekee. Gbatuo ọkụ osiite gi wee sie ya. dgz. Whatsapp Site n'abalị iri atọ na otu nke ọnwa Disemba, ụlọọrụ Whatsapp kwuru na ihe karịrị ijeri mmadụ ise agaghịzị enwe obanzikorita ozi 'Whatsapp' n'ekwentị ha. Atụmaatụ a ga-emetụta ekwenti nwere 'Windows' nke ihe o ji arụ ọrụ nke bekee kpọrọ 'operating system' (OS) karala nka. Ihe isii i na-ekwesịghị ime na social media gị Kedu etu gọọmentị ga-esi chikọta ma hazie Soshal Midịa? Ekwentị ndị a gunyere Nokia Lumia bụ nke kpetere azụ n'iji Windows. Ekwenti a pụtara kamgbe afọ anọ ka na-aga ahịa ruo ugbua. iPhone na-eji iOS 8 nakwa ekwenti Android nwere sọftware 2.3.7 sokwa na ndị ga-adabanye na mmiri ọkụ a site n'ọnwa Februarị nke 2020. Kamgbe ụbọchị mbụ nke ọnwa July, ndị nwere ekwenti "Microsoft store" anaghị ahụ WhatsApp webata n'ekwenti ha. Ụlọọrụ Whatsapp kwuru na mkpebi a hịara ha ahụ mana nke a bụ ụzọ ha si eme ka ndị mmadụ na ibe ha na-akpakọrịta ọfụma. Cheta na ha wepụrụ nkwado ha n'ebe ekwenti akpọrọ 'Blackberry' nakwa ekwenti 'Windows'. Ebelechukwu Obiano o mere alụ? Nwunye gọvanọ Anambra steeti ọ gara mba Amerịka ime ọgọ hapụ ndị Anambra? Ọnụ na-ekwuru gọvanọ steeti ahụ bụ Don Adinuba kwuru na ọ bụ okpokpo asị. Obiano emeela onye Igala kọmishọna Anambra: Willie Obiano a gaala ikele ọyị ya bụ Ooni Ife Kedụ nke bụzị eziokwu? O kwuru na gọvanọ Willie na nwunye ya bi n'obodo Houston dị na mba Amerịka tupu ọ bụrụ gọvanọ Anambra steeti. Adinuba kwuru na nkekọrịta ihe enyemaka nwunye gọvanọ mere n'obodo ahụ abụghị ihe ọhụru kama ọ bụ omenaala ha na-emekarị mgbe bi ebe ahụ nke ha agaghị akwụsị. N'okwu ya, "ọ bụ na ndị mmadụ anaghị anọkata kenye ụmụ ogbenye gbara ha okiri okiri ihe"? Mana lee ihe otu nọ na soshal midia kwuru maka ya bụ atụmaatụ. @JohnFanimokun kwuru na nke a pụtara na ndị Anambra nwezuru ihe niile eji ebi ndụ dị mma. Gịnị ga-eme akwụkwọ ego n̄ọhụụ bụ 'ECO'? Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-eleba anya n'akwụkwọ ego ọhụrụ bụ nke otu ECOWAS kwekọrịtara iji na-atụ mgbere malite n'afọ 2020. Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed kwuru nke a n'akwụkwọ ozi si n'aka onye enyemaka ya bụ Yusuf Tanko Abdullahi. Cheta na ọbụ n'ọnwa Jun nke ka mba niile so n'otu ECOWAS nwere nkwekọrịta na ha ga-ejizi otu akwụkwọ ego a kpọrọ 'Eco' wee na-azụkọrịta ahịa. Ndị gọvanọ achọghị ka ndị agha laa Samuel Ortom bụ gọvanọ Benue Steeti achọghị ka ndị agha si na steeti ahụ pụọ. Ụfọdụ ndị gọvanọ na-arịọ gọọmentị etiti ka ha hapụgodi atụmatụ ịkpọpụ ndịagha na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa. Ndị gọvanọ a na-ekwu na nchekwa adịchabeghi mma dịka ndịagha si ekwu. Benue: Ndị ọchịehị egbuola mmadụ 20 Achọtala ndị uweojii furefu na Benue steeti Cheta na ndịagha kwuru n'ụbọchị Monde na ha ga-amalite ịdọpụta ndị otu ha n'akụkụ obodo dị iche iche. Nke a bụ iji mee ka ndị uweojii weghara ọrụ nchekwa ebe ndị ahụ. Mana gọvanọ steeti Benue, Taraba na Plateau rịọrọ ka gọọmentị ghara ịkpọpụ ndị agha n'ogbe ha. Samuel Ortom nke Benue Steeti gwara ndị ntaakụkọ Punch na "ọtụtụ ndị steeti m ka nọcha n'ụlọ ize ndụ (IDP Camps)". "Anyị na-arịọ ka onyeisiala hapụ ndị agha ka ha nọrọ ruo otu afọ ọzọ." Egwu adịghị maka ụgwọ Naịjirịa ji - Lai Mohammed Lai Mohammed kwuru na Naịjirịa ka mma ugbua n'ọchịchị Buhari Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ekwuola na egwu adịghị maka ụgwọ gọọmentị Naịjirịa ji ma n'ụlọ ma na mba ofesi. Mohammed kwuru oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka na Legọs. O kwuru na ụgwọ Naịjirịa ji karịrị ijeri dọla iri asatọ na atọ. Lai Mohammed: Buhari emeela ọfụma 'Nwunye Kanụ na-arọ nrọ' Mana nke ahụ apụtaghị na ọbụ gọọmentị Buhari bitere ego ahụ niile. Nke ahụ apụtakwaghị na ụgwọ gọọmentị ji na-agbaji ya aka. Mohammed kwuru na "ego gọọmentị na-ebite ugbua bụ iji rụọ ọrụ mmepe dị icheiche." Onyeisi 'Nissan' agbaala ọsọ ndụ Carlos Ghosn kwuru na ọ bụ mmegbu ka ndị ọchịchị Japan na-emegbu ya. Onye bụbu onyeisi ụlọọrụ ụgbọala Nissan bụ Carlos Ghosn agbaala ọsọ ndụ gbaga mba Lebanon n'ihi ebubo mpụ na nrụrụaka e boro ya. A nwụchiri Ghosn n'ọnwa Nọvemba afọ 2018 na mba Japan. Mana onweghị onye ma etu o si mịpụ gbaga Lebanon. Ghosn ekwuola ugboro ugboro na aka ya dị ọcha n-ebubo ndị ahụ a na-ebo ya. Ihu eligwe achaala ọbara ọbara na Ọstralia Ọkụ ọgbụgba mere ka ihu eluigwe gbanwee na Ọstrelịa Puku kwuru puku mmadụ na mba Ọstrelịa na-agbagazi n'akụkụ osimiri ịga zere ndụ n'ihi oke ọkụ ọgbụgba na-achụpụ ha n'ụlọ. Oke ọkụ ọgbụgba a mere ka ihu eluigwe gbanwee na-acha ọbara ọbara nke mere ka egwu jide ọtụtụ ndị mmadụ. Ekpomọkụ eruola digrii iri anọ na steeti niile dị n'Ọstrelịa ugbua. Iheanachọ alọghachila Kelechi Iheanacho nyere goolu abụọ ka ha (ndị Leicester City) na Fleetwood sọrọmpi maka iko FA Nwaafọ Igbo bụ Kelechi Iheanacho ekwuola na obi dị ya mma n'ihi na otu ya bụ Leicester City bụ ndị nke abụọ n'asọmpi English Premier League na-abanye afọ ọhụrụ. Iheanachọ achọtala ụkwụ bọọlụ ya na ọdị nso dịka ọ na-enyezi goolu aghara aghara mgbe ọbụla etinyere ya n'egwu. O kwuru na ha na-agbasị mbọ ike ịhụ gara n'ihu na-emeri asọmpi ha. Football: Onye ga-aga ebee na Jenụwarị Mmadụ abụọ ha apụ n'otu ha na Janụwarị a? Dịka afọ 2019 na-akụrụ ọnụ, ụzọ emegheela maka nzụta na ire ndị ọgba bọọlụ na mba dị icheiche n'ụwa. Ụfọdụ ndị a na-ele anya na ha nwere ike ịhapụ otu bọọlụ ha gunyere Paul Pogba nke Manchester United, ǹa Gareth Bale nke Real Madrid. Ndị ọzọ bụ Olivier Giroud nke Chelsea na Wilfried Zaha nke Crystal Palace. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ruga, Naira Marley, na ihe ndị ọzọ a kacha chọọ n'ịntanetị n'afọ 2019 Gịnị mere ụmụnwaanyị ji amụju ụlọ ebe ha na-achọ nwa nwoke?
[ "Tekinụzụ", "Naijiria", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50960220
Gịnị jịkọrọ ụmụnwaanyị na mmọnwụ?
Ndị omenala doro anya kwuru na mmọnwụ bụ otu ụmụnwoke, ọ bụghị otu ụmụnwaanyị.
2019-12-31T17:32:15Z
Igbo culture: Gịnị jịkọrọ ụmụnwaanyị na mmọnwụ?
Mmọnwụ N'ala Igbo mgbe gboo, mmọnwụ bụ otu na-ahụ maka ikpezi okwu na ịkpa udo n'obodo. A na-agba mmọnwụ n'emume pụrụ iche ọkachasị ma e wechaa ihe ubi, akwamozu nnukwu mmadụ maọbụ okenye. Mmọnwụ wakporo ụlọụka Katolịk n'Anambara Mmọnwụ Coal Camp pụtara ịgba 'Easter' A na-ahụta ya dịka mmụọ ndị nna nna nke mere e ji akwanyere mmọnwụ na ndị bara mmọnwụ nnukwu ugwu. Naanị ụmụnwoke bara mmọnwụ na-eti mmọnwụ. Mana ugbua, ụfọdụ ụmụnwaanyị agba ọhụrụ na-ajụ ihe mere e ji enye ụmụnwaanyị oche azụ n'ihe gbasara iti mmọnwụ. Dịka ndị omenala doro anya siri kọwa, ịba mmọnwụ bụrụ ụmụnwoke, ihe ịbanye otu ụmụada bụ nye nwaanyị. Otu n'ime ha bụ Ọzọ McGinger Ibeneme sị: "Mmọnwụ bụ otu nzuzo. Ọ bụ naanị nwoke bara mmọnwụ na-eti mmọnwụ." "Mmọnwụ abụghị nwaanyị anaghị." "Mmọnwụ abụghị ụzọ imegide ụmụnwaanyị" "Mmọnwụ abụghị ụzọ imegide ụmụnwaanyị, kama ọ bụ maka ichekwa obodo." "Oge gboo, e nwere ọtụtụ otu; otu ụmụnwoke, otu ụmụnwaanyị, otu ntoroọbịa." "Ụmụnwoke anaghị azọ ụzọ ịbanye n'otu ụmụnwaanyị." Nwaanyị nwere ike ịba mmọnwụ Agbanyeghị na mmọnwụ dịrị ụmụnwoke, o nwere ogogo nwaanyị ga-eru, ọ baa mmọnwụ. McGinger gara n'ihu kọwaa, "Nwaanyị bụ agbara nwaanyị maọbụ oke nwaanyị enye ya ohere ọ baa mmọnwụ." Ụdị mmọnwụ dị iche iche Mmọnwụ maka ihe nkiri iji maatụ; Adamma Mmọnwụ maka ichekwa obodo dịka Achịkwụ, Ọgbọagụ Akụkọ ndị ga-amasị: Amụma e buru na 2019: Ndị mezuru na ndị gbara ụka Mwakpo Ekweremadu, ọchụchụ Tacha, ọbịbịa Cardi B na ihe ndị ọzọ ị gaghị echefu maka afọ 2019 Naira Marley, Regina Daniels, RUGA na ihe ndị ọzọ a kacha chọọ n'ịntanetị n'afọ 2019 Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Omenala", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50941369
Ihe ndị a ga-adị ndị a mụrụ bido n’afọ 2000 ka ‘film’
Ụmụaka bekee kpọrọ 'Generation Z' bụ ndị a mụrụ site n'afọ 2000 ruo ugbua, agaghị aghọta ihe e ji ụfọdụ ihe ndị a eme.
2020-01-01T08:31:19Z
New Year's Day: Ihe ndị a ga-adị ndị a mụrụ bido n’afọ 2000 ka ‘film’
Ekwentị na taịpraịta mgbeochie. Ka a na-abanye afọ iri ọhụrụ nakwa agba ọhụrụ ọzọ, ọtụtụ ihe agbanweela nke bụ na ụfọdụ ndị a mụrụ n'otu oge agaghị amata ihe ha bụ. Ihe ndị ahụ bụ ihe ndị dịbu adị mana ụmụaka a mụrụ n'oge Bekee kpọrọ 'Generation Z' (site n'afọ 1999 ruo ugbua), amaghị ya dịka etu a ọ dịbu. Ị nweghi ike ichefu ihe ndị a mere n'afọ 2019 Ihe 6 mere ka 2020 pụọ iche Amụma e buru na 2019: Ndị mezuru na ndị gbara ụka Ha mazị ya ugbua site n'ụzọ ọgbara ọhụrụ e si rụgharịa ya, nke bụ na ihe ndị ahụ adịla mfe iji n'aka na-akpagharị ma ị chọọ. Lee ụfọdụ ihe ndị ga-agba ụmụaka 'Generation Z' gharịị: Kaseetị 'Cassette player': Ụmụaka 'ọgbara ọhụrụ' amaghị mgbe a na-ebu redio ebu kama ịkpa ya n'aka. N'ihe karịrị afọ iri gara aga, a na-etinye ihe a kpọrọ 'kaseetị' n'ime igwe okwu na-enwekarị ma redio ma ihe na-akpọ ya bụ kaseetị, tupu ị gere egwu. Mana ugbua, e nweela ihe dị ka 'YouTube', Audio Mack, Spotify, Boom Play na ihe ndị bụ ebe ị ga-esi butuo egwu ọbụla masịrị gị, tinye ya n'ekwentị gị maka igere ya oge ọbụla ị chọrọ. Ọ bụrụkwanụ na ị chọghị ibutu ya ebutu, ị nwereike lere ya ka vidio n'elu ịntanetị mgbe ọbụla ị chọrọ. Ka ọ dị ugbua, ekwentị niile a na-arụpụta ugbua na-ebu redio n'ime ya; nke ọ ga-abụ ịkwụnye ihe ntị ya nke bekee kpọrọ 'earphone', ọ bụrụzịa gere gawa. Ekwentị: Mgbe ahụ ọ bụ ekwentị a na-ewu, o nwereike ịbụ naanị otu onye maọbụ abụọ nwere ya n'agbataobi, ndị ọzọ a na-abịa aza oku ebe ahụ. Ọ bụrụ na ị ma mgbe a na-eji ekwentị a akpọ mmadụ, e kwesịrị ka a na-akpọ gị 'daa' maọbụ 'dee'. Makana ọ gafeela afọ iri abụọ (20) e wepụtara nke a na-ejizi n'aka nke bekee kpọrọ 'mobile phone'. Ndị ma ekwentị a ma ihe ha ji anya ha hụ gbasara ịkpọ mmadụ. Ọ pụtara na onye ahụ ga-anọgodu nso ya bụ ekwentị tupu ọ zaa ya. Mana ugbua, ọ bụghị naanị na ị ga-anọnwu ebe ọbụla zaa ekwentị gị ma mmadụ kpọọ gị, ị ga-ejinwu ekwentị gị nweta ozi maọbụ chọta ozi site n'ihe a kpọrọ 'ịntanetị'. Ihe e ji emepe komkom Ụfọdụ na-echigide komkom ha n'ala tupu e chipuo isi ya, kama iji ihe e ji emepe komkom mgbe ochie N'agbanyeghi na ụfọdụ ka na-eji mma emepe komkom, e nwere ihe a rụpụtara iche a n-eji emepe ya. Ihe ahụ nke bekee kpọrọ 'tin cutter', bụ ihe a na-eji agba komkom okirikiri. Tupu afọ 2000 eruo, a na-eji nke ọ ga-abụ ị sụnye n'ime komkom ị were aka gị na-akụ n'elu ya, megide etu a wee gazuo okirikiri okwuchi komkom ahụ. Mana ugbua, egwu adagharịala makana ndị nke a na-arụpụta ugbua anaghị ata ndụ mmadụ ahụhụ. Akwụkwọ ozi ịhụnanya (Love letter): Ndị agba ọhụrụ a ka ma na a na-ede leta ugbua? Mgbe ochie bụ na ị ga-ede akwụkwọ ozi, nye mmadụ ka o nye onye i deere ya, maọbụ gaa n'ụlọorụ nzipu ozi a kpọrọ 'post office' ịga zipu ya. Mana ụbọchị agbanweela ugbua, kama ogologo usoro ahụ, ị ga-edenwuzi ihe bekee kpọrọ 'text message' n'elu ekwentị gị, zipu ya na-erughi otu nkeji, onye ahụ asakwaa gị ozugbo. Nke ugbua bụ na ị nwere ike zie onye ị chọrọ izi ozi, ihu na ihu site na nke a kpọrọ 'video call'. Owu e ji akpa isi: Ụmụaka ọgbara ọhụrụ nwereike ha ahụtubeghidị owu isi a anya mbụ makana a na-achọzị ya achọ n'ahịa. Mana oge ọ na-ewu, ihe a bụ ihe e ji eke isi dị iche iche, na-achọ mma n'ụzọ pụrụ iche. Akụkọ kwukwara na ọ na-enye aka ime ka ntutu mmadụ too ogologo. Ugbua, kama iji isi owu kee isi, e nweela nke a na-akpọ 'attachment', 'weaveon' nakwa ndị ọzọ dị iche iche a na-eji eke isi. 'Typewriter' Ọ bụrụ na ị ji taịpraịta gụọ akwụkwọ maọbụ rụọ ọrụ, ekelekwaa m gị oo! Kọmputa pụtara ụwa napụzịa taịpraịta ọrụ ọ na-arụ bụ iji ya ebi ihe n'akwụkwọ. Ugbua, kama ọ ga-abụ i jiri taịpraịta na-ede ihe ị gbaa mbọ hụ na i tinyere 'ịnk', na ị kwagharịkwara ya ma ị degide ruo n'isi dgz, ị ga-edenwuzi ihe niile ị chọrọ n'elu kọmputa gị, na-atụfughi ụra n'ebe ị ga-esi weta ịnk makana ọ gwụlahịri gị. Kọmputa emeela ya ka ọ dị mfe ide ihe na mpempe akwụkwọ. Kedụ ndị ọzọ ị ma? Akụkọ ndị a ga-amasị gị: Gịnị jịkọrọ ụmụnwaanyị na mmọnwụ? Ị nweghi ike ichefu ihe ndị a mere n'afọ 2019 Naira Marley, Regina Daniels, RUGA na ihe ndị ọzọ a kacha chọọ n'ịntanetị n'afọ 2019 Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Omume", "Nnwogharị", "Naijiria", "Ụmụaka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50963780
Amụma Mbaka maka Hope Uzodinma, Buhari ekwuola okwu, bịa gere ozi ndị ọnụ na-eru n'okwu
Lee ihe Mbaka, Buhari na ndị ọzọ kwuru maka afọ ọhụrụ 2020.
2020-01-01T09:06:21Z
New Year 2020: Amụma Mbaka maka Hope Uzodinma, Buhari ekwuola okwu, bịa gere ozi ndị ọnụ na-eru n'okwu
Amụma Mbaka maka afọ 2020 Afọ ọhụrụ 2020 eruola, iji nabata ya, ndị ọnụ na-eru n'okwu ekwuputewela ebumnobi nakwa nchekwube ha nwere maka ya. Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu ụlọ ụka e ji 'Adoration Ministry' mara, buru amụma ka ọ na-aka ụka isi abalị 31 nke ọnwa Disemba gafeta ụbọchị mbụ nke Jenụwarị. N'amụma o buru, o kwuru na mgbanwe ga-abịa n'ọchịchị Imo steeti n'afọ 2020; na "Chukwu ga-ehicha ndị Imo steeti anyammiri". Ọchịchị Buhari bụ 'Demon-cracy' ọ bụghị Democracy - Fr Mbaka Fada Mbaka asaala ndị na-akọtọ ya Amụma e buru na 2019: Ndị mezuru na ndị gbara ụka Ọ gara n'ihu sị na ọ na-akpọku Hope Uzodimma zọrọ oche gọvanọ Imo steeti n'okpuru APC, ka o bilie gaa were ọchịchị Imo n'afọ a. O kwuru sị na ọ na-enye ya ikike ime mmụọ 'spiritual empowerment' iji were ọchịchị. Gbasara Naịjirịa, Mbaka kwuru na a ga-enwe ihe juru anya gbasara ọchịchị n'ogo federalụ nakwa steeti nke ga-ebute mgbanwe. Anyị chọrọ Biafra, ọ bụghị 'restructuring- Nnamdi Kanu Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola kwusie ike na ihe ya na ndị otu Ipob chọrọ bụ Biafra ọ bụghị nhazigharị Naijiria na mpaghara na mpaghara. Kanu, onye kwuru nke n'ozi afọ ọhụrụ o wepụtara kwuru na onweghị ka ndị ọnụ na-eru n'okwu nye ohere maka nhazighari Naijiria. "Ihe anyị chọrọ bụ Biafra, o nweghị ihe ọzọ." "Anyị agaghị atufu mbọ inweta Biafra maka 'restructuring'." O gara n'ihu kwuo na ihe mere ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria achọghị ka onye Igbo bụrụ Onyeisiala bụ na ha na-etụ egwu na onye Igbo bangye n'ọkwa ahụ ọ ga-ahazigharị Naijiria. Umaro Sissoco Emballo enwetala ọkwa onyeisiala Guinea Bisau Umaro Sissoko Emballo,emeriela na ntuliaka onyeisiala mba Guinée Bissau Umaru Sissoco Embalo emeriela na ntụlịaka onyeisiala mba Guinea Bissau Embalo onye bụbu Prima Minista na mba ahụ site n'afọ 2016 rue afọ 2018 ji vootu dị pasent 54% merie. Embalo, onye kụbụrụ Domingos Simoes Pereira na asọmpi ahụ ga-anọchi onyeisiala mba ahụ bụ Jose Mario Vaz onye achịtaghị aja na ntuliaka ahụ e mere. Pope arịọla mgbaghara maka ịkụ nwaanyị ihe Onyeisi ụka Katọlik na mba ụwa bụ Pope Francis ekwuola na o bụ n'ihi e jideghịnwu onwe ya mere ya ji kụọ nwaanyị ihe n'emume ịba afọ ọhụrụ nke 2020 e mere na Peter's Square. N'ihe onyonyo wuru na soshal midia, Pope Francis gbarụrụ ihu dịka otu nwaanyị n'ime ndị ọbịa bịara emume ahụ jidere ya ma dọọ ya aka n'ike. Nke mere ka ọ kụ ya bụ nwaanyị ihe n'aka ugboro abụọ dịka ọ na-azọrọ onwe ya. Mana Pope nọrọ n'ụka afọ ọhụrụ were rịọ gbaghara sị, "Anyị anaghị ejidenwu onwe anyị ọtụtụ mgbe." "Ọ meela mụ onwe. Gbagharanụ m maka atọghị ezi ụkpụrụ ụnyaahụ." Onyeisiala Muhammadu Buhari gwara ọha okwu Kama ịgwa ọha okwu site n'ihe nkiri dịka onye ọbụla na-atụ anya ya, Buhari si n'elu soshal midia ya zipu ozi nnabata afọ ọhụrụ ya. Ebe ahụ, o kwuru etu ọ ga-esi rituo ma wepụ aka n'ihe gbasara ịzọ ọchịchị n'afọ 2023. Ọ gara n'ihu kwuo na ihe kachasị ya mkpa bụ inweta ezi nchekwa na obodo na ụmụ Naịjirịa. Lee ihe ndị ọzọ dị mkpa o kwuru. Ọchịchị m ga-agba mbọ hụ na anyị sonyere ihe iwu ala anyị na-ekwu Atụmaatụ ọhụrụ anyị biputara gbasara akụ na ụba Naịjirịa bụ nke ga-achụpụ ụbịam na ndụ ndị ala a. Ọchịchị m na-ahazị ụgbọ ụlọko ga-esi Lagos gawa Kano Anyị na-aga n'ihu n'ọrụrụ Second Niger Bridge, Lagos - Ibadan Expressway nakwaAbuja - Kano highway Ọchịchị m ga-ewepụta ohere ọhụrụ gbasara ikọ ubi A ga-emepekwa ọdọụgbọelu Enugu, Lagos, Kano, Maiduguri n'afọ 2020 a Ego si mba ofesi bata Naịjirịa Abike Dabiri Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ụmụ Naịjirịa bi na mba ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa ekwuola na ego ụmụ Naịjirịa bi mba ofesi webatara n'afọ 2019 pụtara ijeri dọla iri abụọ na ise. Dabiri kwuru na ego ahụ ga-akarị maka na ọ bụchaghị akụkụ niile e si zibata ego ka ha lebara anya oge a na-eme mgbakọ ahụ. O kwukwara na ọtụtụ ndị bi na mba ofesi na-ekwu na o kwesịrị ka e nye ha ohere iso na-atụ vootu na Naịjirịa n'ihi na ha na-atụnye nnukwu ihe na akụnụba Naịjirịa. Dabiri kwuru na ndị omeiwu kwesịrị ileba anya etu a ga-esi mee ka ndị Naịjirịa bi n'ofesi soro na-atụ vootu. Adeboye kwukwara nke ya Ụkọchukwu ndị Redeem Christian church of God bụ Adeboye Enoch kwuru na gị na ndị be gị ga-enwe ọṅụ akwụsị akwụsị. O kwuru na ị ga-enwe mmeri akwụsị akwụsị, nke pụtara na ị ga-enwe ọtụtụ mgba mana ị ga-emeri. N'okwu ya, "Ala ga-ama jiji dịka nwa akwụkwụ na-adọ, nke a ga-eme n'ọtụtụ ebe a na-atụghị anya."Ọ rịọrọ ka ekpere Naịjirịa ekpere, Chukwu ga-enye aka. "A ga-nwe mgbanwe ọchịchị n'ọtụtụ mba, ụfọdụ mgbanwe ọchịchị a ga-eji nsogbu bịa ebe ụfọdụ ga-aga nkeọma." Chris Oyakhilome agbajọghị Onye ndu ụka Christ Embassy akpọrọ Ụkọchụkwụ Chris Oyakhilome kpebiri na afọ 2020 a bụ nke izuoke. O kwuru na-enwere owuwe ihe, nwekwa owuwe ihe kachisinu mana ihe ezipụrụla na mmụọ bụ owiwe ihe dị ukwuu. O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-aka ụka mgafe ịbanye afọ ọhụrụ. Ihe David Oyedepo nke ụka "Winners Chapel" kwuru Ụkọchukwu Oyedepo kwuru na ụmụ Chineke ga na-eme ihe ọma n'enweghị mgbochi. O kwuru na ha ga-enwere onwe ha gbasara ihe ọ bụla na-akwụsị ha i me ihe ịribama. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọ bụ oke Ndigbo iwepụta onyeisiala n'afọ 2023 - Nnia Nwodo Ihe ndị a ga-adị ndị a mụrụ bido n’afọ 2000 ka ‘film’ Ọkụ erepịala ihe karịrị ụlọ 200 Gịnị jịkọrọ ụmụnwaanyị na mmọnwụ?
[ "Naijiria", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50963778
Ihe mere na ndị Ugwu achọghị ka onye Igbo bụrụ onyeisiala - Nnamdi Kanu
Nnamdi Kanu, onyeisi otu Ipob ekwuola na ya agaghị ala azu na mbo nnwereonwe Biafra.
2020-01-01T11:06:10Z
New Year 2020: Okwu ise gbara ọkpụrụkpụ Nnamdi Kanu kwuru n'ozi afọ ọhụrụ
Nnamdi Kanu Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ekwuola na ihe mere ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijiria achọghị ka onye Igbo bụrụ Onyeisiala bụ na ha na-ekwu na ndị Igbo ga-ahazigharị Naijiria nke bekee kpọrọ "restructuring." Kanu onye kwuru nke n'ozi afọ ọhụrụ o wepụtara kwuru na ya na ndị otu ya kwụsiri ike na okwu nnwereonwe Biafra. Ọkaikpe ga-ekpe Nnamdi Kanu ikpe abịaghị ụlọikpe taa Allen Onyema tụkwasịrị m asị - Nnamdi Kanu Ihe 5 Allen Onyema gwara Nnamdi Kanu O kwuru sị: "Biafra ga-abịa na mmezu ka anyị ka dị ndụ." "Ihe anyị chọrọ bụ Biafra, o nweghị ihe ọzọ." "Anyị agaghị atufu mbọ inweta Biafra maka 'restructuring'." "Onye ọbụla na-agba mbọ 'One Naijiria', achọghị ọganihu ndị Owuwa-Anyanwu". A ga-amụ ụmụ 26,039 na Naịjirịa taa - Unicef Jidenna na-anyị kilogram atọ oge a mụrụ ya Ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka bụ Unicef, ekwuola na a ga-amụ ihe karịrị ụmụaka puku narị atọ na iri itoolu na abụọ (392,078) naanị n'ime taa bụ mbido afọ ọhụrụ. N'ime ọnụọgụgụ ahụ, ha kwuru na Naịjiria ga-eketa ụmụ puku iri abụọ na isii na ụma (26,039) n'ime ndị a ga-amụ taa. First baby: Nwa mbụ a mụrụ n'Alaigbo na 2019 E jirila akpanwa onye nwụrụ anwụ mụta nwa dị ndụ Unicef ji ohere ahụ kpọkuo ndị mmadụ ọkachasị gọọmentị mba dị iche iche, sị ka e tinyekwuo ego n'ihe gbasara nlekọta ndị ọrụ ahụike. Ha sị ka e nye ha ezi ọzụzụ, nye ha ezigbo ọgwụ ha ga-eji na-elekọta nwaanyị dị ime, nne na nwa a mụrụ ọhụrụ nakwa igbochi ọgbatughie nwereike ịdakwasị nwaanyị dị ime. Mbaka buru amụma Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu Katọlik ọnụ na-eru n'okwu, ebuola amụma ebe ọ sị na mgbanwe ga-abịa n'ọchịchị Imo steeti n'afọ 2020; na "Chukwu ga-ehicha ndị Imo steeti anyammiri". Mbaka kwuru sị na ọ na-enye Hope Uzodimma zọrọ oche n'okpuru APC ikike ime mmụọ ọ ga-eji bilie weghara ọchịchị steeti ahụ. Buhari kwukwara nke ya Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwukwaala ọzọ na ọ gaghị azọ ọkwa ọchịchị n'afọ 2023 dịka akụkọ na-efegharị. O kwuru nke a n'ozi nnabata afọ ọhụrụ o nyere taa. Gụzuo ya n'uju ebe a: Fada Mbaka ebuola amụma, Muhammadu Buhari ekwuola okwu, bịa gere ozi ndị ọnụ na-eru n'okwu Arsenal ga-ezute Manchester United Ọ ga-akpọtụ akpọtụ taa mgbe Arsenal ga-anabata Manchester United n'Emirates. Dimkpa abụọ a ga-agba egwu onye ike ga-agwụ, ịma onye bụ eze n'etiti ha n'afọ ọhụrụ a. Ọkụ erepịala ihe karịrị ụlọ 200 Ụlọ na-agba ọkụ n'obodo Mallacoota Ọkụ erepịala ụlọ narị abụọ ọzọ na mba Ọstrelia. Ọkụ oke ọhịa a malitere kemgbe izu abụọ gara aga ka na-agba si n'obodo fere n'obodo dịka New South Wales, Victoria na East Gippsland. Ụlọikpe etinyela ọnụ n'okwu nwaanyị megburu odibo ya: Ụlọikpe ekwuola ka a ka jichie Amaka Otolehi bụ nwaanyị a hụrụ n'ihe nkiri ka ọ na-apịa odibo ya n'ala. E jichikwara nwanne nna nwata ahụ bụ Jonathan Geowam, onye ghọgburu nne na nna ya sị na ọ na-etinye ya n'ụlọakwụkwọ. Ọdọụgbọelu n'Ebọnyi? Gọvanọ Ebonyi steeti bụ David Umahi ekwuola na ha ga-arụcha ọdọụgbọelu a ga-esi na-efepụ Naịijiria na steeti ahụ n'ime ọnwa iri na asatọ na-abịa. O kwuru na ebe a na-ejikarị ihe dị ka site afọ isii ruo iri arụ ọdọụgbọelu, na nke a agaghị egbu ụdịrị oge ahụ, mana ọ ga-eso na ndị kacha mma n'ụwa. Chelsea ga-akwata ya taa: Ndị Chelsea ga-aga njem n'ụlọ ndị Brighton bụ ebe nwaafọ Naịjirịa bụ Leon Balogun na-agba bọolụ. Chelsea na-atụ anya imerikwa ha nke ugboro iri dịka ha si emeribu ha mbụ. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50963438
I nwere mkpebi maka afọ ọhụrụ a? Lee ụzọ ise ị ga-esi mezuo ya
Lekwa ka ị ga-esi mezuo nkwa ị kwere onwe gị n'afọ ọhụrụ a ka obi bụrụ gị sọ ọṅụ.
2020-01-01T12:04:55Z
2020 New Year: I nwere mkpebi maka afọ ọhụrụ a? Lee ụzọ ise ị ga-esi mezuo ya
Ndị ntoroọbịa Afọ 2020 amalitela, anyị anabatala afọ ọhụrụ. Ọtụtụ n'ime anyị na-ahụ oge a dịka mgbe ha ji eme mkpebi ime ihe ga-abara ha uru. O nwereike ịbụ ichuso ezigbo ahụike, ihazi ego gị, imụta aka ọrụ ọhụrụ maọbụ ịkwụsị ụfọdụ agwa kpam kpam. Etu ị ga-esi egbochi mmerụ ahụ si n'ọkụ ekwentị Etu ị ga-esi echekwa onwe gị n'ọkọchị Etu ị ga-esi mara onye nwere ike ịkwụ ụdọ Otu ihe kacha dị ezigbo mkpa na mkpebi ọbụla i mere bụ nkwalite mmụọ mana mụ na gị ma na ọ naghị adịcha fecha fecha. Atụmatụ a na-atụpụtaghị ọfụma nwereike ịda mba Naanị mmadụ ruru pasentị asatọ na-emezu nkwa ha kwere onwe ha n'afọ ọhụrụ dịka otu nchọpụta e mere na Mahadum Scanton nke Statistic Brain wepụtara. O kwesịghị ịbụ gị. Lee ụzọ ise ị ga-esi gbanahụ akwụdoghị na mkpebi i mere n'afọ ọhụrụ. Ya gaziere gị! 1. Bido obere obere Bido n'ikpebi obere ihe ị ga-emeli. I bido na nke nke, ị nwereike igbago n'ogo dị elu. Ụfọdụ na-eche na a ga-eji 'abracadabra' wee nwete ihe ha na-achọ dịka Rachel Weinstein bụ ọkammụta n'ihe gbasara etu mmadụ si akpa agwa si depụta. Iji maa atụ, malitegodu na-agba ọsọ ọha a kpọrọ 'marathon' site n'igorogodu akpụkpọụkwụ ị ga-eji na-agbachara ọsọ n'ime ụlọ gị. Ị chọrọ ịbụ ọkachamara n'isi nri, ọ ga-adị mma isoro onye ma anya ya ọfụma na-emechara ya tupu i nwee ike ịkwụdo ọfụma. Makana n'ezie n'ezie mgbanwe na-abịa na nke nke dịka Weinstein si kwuo. 2.Kpọọ okwu aha Anyị na-enwekarị ihe anyị chọrọ ime n'obi mana anyị enweghị eserese etu anyị ga-esi mezu ya. Ọ dịmkpa ime nke a. Iji maa atụ, kama isi m ga-anagakarị ụlọ mgbati ahụ n'afọ, ọ ga-adị mma ka ikwu ụbọchị ndị ị ga-anaga ya bụ ebe n'ime izụ ụka. Nke a ga-eme ka mkpebi gị bụrụ ihe mmezu kama ị bụ naanị ihe okwu ọnụ dịka ọkammụta Neil Levy nke mahadum Oxford si depụta. 3. Chọọ ndị gị na ha ga-ejikọ aka Ịchọta ndị gị na ha ga-agakọ njem imezu ebum no obi gị gbasara afọ ọhụrụ a na-agbakwa ume. Nke a gunyere na ịchọta ọyị gị, gị na ya ga na-agakọ ọmụmụ gbasara ihe ahụ ịchọrọ ịmụta maọbụ ikwupute mkpebi gị ka ọha nụrụ ya. Dr John Michael na-akuzi na mahadum Warwick ekwuola na inweta nkwado n'aka ndị ọzọ ga-enye aka ime ka ịnweta ihe na-achọ ọsịsọ. 4. Merie Ikpụ afọ n'ala Ihe sie ike, gba nkiti ma nyochakwa ọnọdụ ọzọ ọfụma. Kedụ ihe mgbochi ị gabigara?Kedụ ụzọ kacha dịmma is igboo ya?Kedụ nke na-adabaghị. Gwa onwe gị eziokwu ma ṅụrịa ma onwe nke ịmetere ọfụma. Iji ma atụ, ọ bụrụ na ịxchọrọ ị na-eri ezigbo nri , kama iri achịcha ọcha, rie nri esi n'Oka wee mepụta. I nwekwara ike hapụ iri ihe ntacharị ọnụ na-ebute ibu ma na-eri ihe ntacharị ọnụ eji mkpuru osi na-edozi ahụ. 5.Kwe ka mkpebi gị na ihe ga-eme n'ọdịnihu Mkpebi kachasịnụ bụ nke ya ị na ebum n'obi gị n'ọdịnihu na-agakọ karịa ma ina-etigharị dịka ọkammụta na agwa mmadụ bụ Dr Anne Swinbourne si kwu. Ọ bụrụ na igosi beghị mmasị gbasara egwuregwu, ọ baghị uru ịrọwa nrọ ị bụ ọkaibe na ya. Naanị mkpebi siri ike ezughị ime ka o mezuo, ị ga-eji eserese ị ga-eji me ka ọ bịa na mmezu. Ụjọ atụkwalagị ị nweta nkwado maọbụrụ na ọhịawara gị ahụ imezu nkwa ịkwere onwe gị n'afọ ọhụrụ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ọkụ erepịala ihe karịrị ụlọ 200 Ị nweghi ike ichefu ihe ndị a mere n'afọ 2019 Gịnị jịkọrọ ụmụnwaanyị na mmọnwụ?
[ "Omume", "Naijiria", "Nrị na-edozi ahụ", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50913563
Ihe mere anyị ji kpọnye mmadụ nwa anyị - Ndị mụrụ nwa a pịara n'ala
Nwatakịrị nne ya ukwu kụrụ n'ala n'Enugwu alaghachila na-aka nne na nna ya.
2020-01-01T17:45:20Z
Child Abuse: Ndị uweojii enyeghachila nwa a pịara n'ala ndị mụrụ ya
Nwata a pịara n'ala na ndị mụrụ ya Obere nwatakịrị nwaanyị ahụ dị afọ asatọ bụ Peace Goewan nke nne ya ukwu buliri ka ndị na akụ ọkpọ were kụọ ya ukwu na-ala abụrụla onye ndị uwe ojii nyefere n'aka nne na nna mụrụ ya. Nna peace bụ Nicodemus Goewan na nwunye bụ Jane kwuru na ọ bụ nwanne ya nwoke bụ Jonathan Goewan ka ya dunyere nwa ya n'ihi nkwa o kwere na ya ga azụ ya n'ụlọakwụkwọ. A machiela ịpịa ụmụaka ụtalị na Saụt Afrịka Iwu emegideghị nwa nwoke dị afọ 17 lụrụ nwaanyị n'Anambara- Ọkaiwu 'A kpụrụ ya gaa n'arụsi iji duo ya iyi na ọ gaghị ahapụ di ya' Ọ kwara arịrị na mmegbu nwa ya gabigara na-aka nne ya ukwu bụ Amaka Otolehi ma kelee Chukwu na nwa dị ndụ. Nne nwata ahụ kwuru na ọ bụ ihe isi ike mere ya jiri kponye nwanne di ya nwa ya. Cheta na ihe onyonyo na-ata anya arụ nke gosiri nwaanyị ebe ọ pịara nwatakịị n'ala wuru na soshal midia izuụka ole ma ole gara aga. Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Ahmad Abdulrahman gwara ndị ntaakụkọ nke a ma gosi na ọ hanyela nne na nna nwa ahụ n'aka ha. Abdulrahman kwuru na ịtụ mgbere nwa ma ọ bụ iji nwa mmadụ mere ohu megidere iwu obodo Naịjirịa. Ọ dọrọ aka na ntị na onye ọbụla aka ya dị na ya bụ ihe ga-enweta ntaramaahụhụ dịka iwu si dị. O kwuru na ndị uweojii n'Enugwu akpụpụla nwaanyị ahụ bụ Amaka Otolehi n'ụlọikpe tinyere ndị niile aka ha dị na ya bụ iji ụmụaka eme ohu ma ọ bụ ịtụ mgbere mmadụ. Ndị uweojii anwụchiela nwaanyị pịara nwaodibọ ya n'ala Nwaanyị pịara nwaodibo ya isi n'ala akwaala arịrị ma rịọ ka a gbaghara ya. Nwaanyị ahụ aha ya bụ Amaka Otolehi kwuru na ọ bụ iwe ọkụ tinyere ya n'ọnwụnwa. Aka ndị uweojii kpaara nwaanyị ahụ oge ihe onyonyoo ebe ọ na-akụ nwata ahụ a kpọrọ 'Peace' ihe gbasara na soshal midia. Iwe juru ọtụtụ ndị mmadụ afọ oge ya bụ ihe onyonyoo gbasara. Mana n'ihe onyonyo ọzọ nke gosiri ebe ndị uweojii na-agba nwaanyị ahụ ajụjụ, o kwuru na ya abụghị ajọ mmadụ. "Mụ na Peace ebiela ihe karịrị afọ abụọ, ọbụghị etu a ka m si emeso ya." "A hụrụ m ụmụaka n'anya nke ukwu. A na m eme Peace ka nwa m." "Ọ bụ oke iwe mere m ji kpaa ụdị agwa ahụ. Biko gbagharanụ m." Kọmịshọna ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ahmad Abdulrahman, kwuru na ha na-enyocha okwu ahụ ebe ha ga kpụpụ nwaanyị ahụ ụlọikpe ma ha mechaa nke a. Ọ gara n'ihu kwuo ha ga na-elekọta nwata ahụ ganye oge ha ga-enyefe ya n'aka ụlọrụ gọọmenti. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ị na-arụ ọrụ ndị a? Chefuo maka 'ezumike' nke ekeresimesi a Ọkụ agbaala ụlọ karịrị 120 n'ụbọchị ekeresimesi Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ịtọhapụ Sowore na Dasuki Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Enugu Steeti", "Mmeru nwata" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50970138
Pepe ndị Arsenal agbaala Manchester United ose n'anya n'afọ ọhụrụ
Arsenal ji ọkpụ goolu abụọ gbagbuo Manchest United ụbọchị Wenezde.
2020-01-02T05:24:58Z
Arsenal vs Manchester United: 'Pepe' ndị Arsenal agbaala Manchester United ose n'anya n'afọ ọhụrụ
Pepe nyetere ofu goolu n'asọmpi ahụ Pepe nyetere ofu goolu n'asọmpi ahụ Ọbịbịa Mikel Arteta dịka onye nkuzi ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal amalitela ịmịta mkpụrụ. Arsenal ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Manchester United n'abalị Wenezde. Manchester United so Arsenal alọ ka Ọgbọnọ Ọkpụkpụ agbadola Manchester United n'olu na Bournemouth Nke a bụ mmeri mbụ Arteta na-enweta kamgbe ọ malitere ọrụ n'Arsenal. Pepe nyere goolu nke mbụ ka ọ gachara nkeji asatọ ya bụ asọmpi malitere. Ka ọ gachara nkeji 42, Sokratis Papastathopoulos nyere goolu nke abụọ. Nke a bụ mmeri nke mbụ Arteta na-enweta kamgbe ọ malitere ọrụ dịka onye nkuzi ndị Arsenal. Mmeri a mere ka Arsenal gbagote n'ọnọdụ ndị nke iri na tebulu 'English Premier League'. Pepe, bụ onye Arsenal ji nde paụnd 72 zụta n'ọnwa Ọgọst ritere nzere ọkacha agba na ya bụ asọmpi. Ọ bụghị naanị na Pepe nyere goolụ na asọmpi a, ọ gbakwara bọọlụ kụrụ n'igwe. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe mere na ndị Ugwu achọghị ka onye Igbo bụrụ onyeisiala - Nnamdi Kanu I nwere mkpebi maka afọ ọhụrụ a? Lee ụzọ ise ị ga-esi mezuo ya Ihe mere anyị ji kpọnye mmadụ nwa anyị - Ndị mụrụ nwa a pịara n'ala Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Egwuruegwu", "Manchester United", "Bọọlụ", "Arsenal" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50970142
Ọ bụ sọ Mbaka ka Chineke na-agwa okwu? - PDP Imo steeti
Ọnụ na-ekwuru otu ndọrọndọro PDP n'Imo Steeti kwuru na amụma Mbaka buru abụghị eziokwu.
2020-01-02T11:50:16Z
2020 Prophecies: Ihe PDP sara Mbaka gbasara amụma 2020
Emeka Ihedioha, Fada Mbaka na Hope Uzodimma "Mbaka ọ bụ ọkaikpe? Mbaka ọ bụ 'Supreme Court'? Ọ bụ sọ Mbaka bụ onye amụma Chineke na-agwa okwu?" Nke a bụ ajụjụ Damian Opara bụ ọnụ na-ekwuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' nke Imo steeti na-ajụ. Ọchịchi Buhari dị mma- Mbaka Ọchịchị Buhari bụ 'Demon-cracy' ọ bụghị Democracy - Fr Mbaka Opara jụrụ ajụjụ a gbasara amụma afọ ọhụrụ nke Mbaka buru. N'amụma ahụ, Mbaka kwuru na Hope Uzodimma ga-eweghara ọchịchị n'aka gọvanọ Emeka Ihedioha n'oge adịghị anya. Mbaka kwuru na ọ bụ Uzodimma bụ olileanya ndị Imo steeti. Hope Uzodinma ji aha APC zọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti na ntuliaka 2019 Cheta na Uzodimma so wee zọọ ọkwa gọvanọ ime n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC mana ọ dara. O mechara buru okwu ahụ gaa ụlọikpe ma dakwaa ọzọ. Na mkparịtaụka ya na ndị BBC Igbo n'ụbọchị Tọzde, Opara kwuru na amụma ahụ Mbaka buru enweghị isi. O kwuru sị: "O doro anya na Mbaka bụ onye otu APC." "Ọ kwụnyere Buhari megide ndị Igbo na ntuliaka niile e merela." "Mana amụma ya abụghị eziokwu n'ihi na ụlọikpe 'Supreme Court' ekpebiela ikpe ahụ. Opara kwuru na ndị PDP nakwa ndị Imo steeti niile kwụ Gọvanọ Ihedioha n'azụ. O kwukwara na amụma Mbaka anaghị echu ha ụra n'ihi na ọ bụghị naanị ya bụ onye amụma Chineke na-agwa okwu. Amụma Mbaka buru maka afọ 2019 Mbaka sị na 2020 ga-abụrụ Naịjirịa afọ mgbanwe. Ọ sị na a ga-enwe ọtụtụ ihe ịtụnanya n'ọchịchị gọọmenti na Naịjirịa ma n'etiti ma na steeti ga-emetụ onye ọbụla ruo ọkpụkpụ. O buru amụma na mgbanwe ga-abịa n'ochichi Imo steeti n'afọ 2020. Ọ sị na Chukwu ga-ehicha ndị Imo steeti anya mmiri. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe iri ị na-amaghị maka nwaada Amaka Igwe larala mmuọ Gọọmentị Kwara akụtuola ụlọ Saraki Ihe mere na ndị Ugwu achọghị ka onye Igbo bụrụ onyeisiala - Nnamdi Kanu Ọ bụ oke Ndigbo iwepụta onyeisiala n'afọ 2023 - Nnia Nwodo Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Emeka Ihedioha", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "All Progressives Congress", "Hope Uzodinma", "Imo steeti", "PDP (People's Democratic Party)" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50970139
PDP akatọọla Gọọmentị Kwara maka ikụtu ụlọ Saraki
Otu PDP akatọọla Gọọmenti Kwara maka ikutu ụlọ onye bụbụ onyeisi ụlọomeiwu Ukwu Naijiria bụ Senetọ Bukola Saraki.
2020-01-03T04:47:49Z
Bukola Saraki: Gọọmentị Kwara akụtuola ụlọ Saraki
PDP akatọọla Gọọmentị Kwara maka ikụtu ụlọ Saraki Ile Arugbo Ọ bụ n'isi ụtụtụ Tọzde ka a kuturu ụlọ ahụ Otu PDP akatọọla nkwatu gọọmentị Kwara steeti kwaturu ụlọ Sinetọ Bukola Sarakị, si na ọ bụ mkpagbu otu ndọrọndọrọchịchị ndị anọghị na gọomentị. Gọọmentị Kwara Steeti kụturu ụlọ Saraki n'isi ụtụtụ ụbọchị Tọzde, bụ ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2020. Bukola Saraki agbajọọla ndị APC Saraki azaghachila ndị uweojii Saraki ga-alaghachị n'ụlọ ikpe N'ozi PDP wepụtara nke odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Kola Ologbodiyan binyere aka, pati ahụ kwuru na ọ bụ "akpọmasị nakwa enweghị obi ịnabata ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ" mere ọchịchị APC na steeti ahụ ji kpaa ụdịrị agwa ahụ. Gọọmentị Kwara kụturu ụlọ Saraki Saraki chịrị afọ asatọ dịka onye Gọvanọ kwara Steeti Ndị nọ mgbe ya bụ ihe mere kwuru na ọ bụ n'elekere anọ nke ụtụtụ ka ụgbọala katapila gara pịatuo ụlọ ahụ. Ọ bụ nna Bukola Saraki bụ Olusola Saraki nwe ụlọ ahụ wee nyefee ya nwa ya. Ụlọọrụ gọọmentị bụ nke a chọrọ ịrụ n'ala ahụ Mana gọvanọ Kwara Steeti bụ Abdulrahman Abdulrazaq, kwuru na gọọmentị ewegharala ala ahụ. O kwuru na gọọmentị ga-arụ ụlọọrụ maka ndị ọrụ steeti n'ebe ahụ. N'aka nke ya, Saraki kwuru na ya bụ ihe bụ mmegbu nke gọọmentị na-emegbu ya na ezinaụlọ ya. O kwuru na ya ga-aga ụlọikpe ịga gbaghaa ya bụ ihe. Saraki mechara kelee ndị mmadụ gosiri ya nkwado dịka akụkọ ihe mere wusara ebe nile. Ọdọụgbọelu Akanu Ibiam ga-emepe tupu a gbaa Ista - Gọọmentị Etiti Minista na-ahu maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwela nkwa ma kwubie na ọdọụgbọelu nke Akanu Ibiam dị na Enugwu steeti ga-ebido ọrụ tụpụ emee emume Ista nke afọ a. Sirika kwuru nke a mgbe ọ gara ngagharị ile otu ọrụ si aga n'ọdọ ụgbọelu ahu ma kwuo na obi dị ya mma etu ọrụ si aga. Ọrụ na-aga maka ịrụcha ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dịka goọmentị siri kwuo Osote onyeisi Gọvanọ Enugwu steeti bụ Oriaku Cecelia Ezilo kọwara maka mkpa ọdọụgboelu a dịịrị ndị Igbo ma kwuo kwa na Gọomentị Enugwu Steeti dị Njikere ịhụ na-arụchara ya. Ọ bụ eziokwu na ọrụ amalitela n'ọdọụgbọelu dị n'Enugwu? Etu Akanu Ibiam si bụrụ onye a ma ama ugbua N'otu aka ahụ ka omeiwu Nnoli NNaji kwukwara na ụloọmeiwu emezuola ihe niile ha kwesiri ime iji hụ na ya arụchara ọrụ ọdọụgbọelu Akanu Ibiam. Ụkọ ego ga-adị n'afọ 2020 Ụkọ ego ga-adị n'afọ 2020 Onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnụba bụ Bismack Rewane agbaala ama n'ụkọ ego ga-adị n'afọ 2020. Rewane, onye nwe ụlọọrụ 'Financial Derivatives' kwuru nke a n'ọgbakọ ụtụtụ nke Lagos Business School mere na nsonso a. Ọ ginịdị ka Soludo na ibe ya ga-arụrụ Buhari? Economic Advisory Council: Ugbua ka Buhari biara - Ezekwesili Ọ sịrị na ihe ga-akpata ụkọ ego bụ mbuli ego ụtụisi VAT site na pasent ise rue pasent asaa na ọkara, mbuli ego ọkụ latrik nakwa iweghachi 'toll gate'. O kwuru na nzọpụkwụ ndị a ga-ebute oke ọnụahịa. Mana Rewane gara n'ihu kwuo na ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ ga-eme ka ndị ọrụ kụrụtụ ume ndụ. Ihe NBA gwara Buhari maka afọ ọhụrụ Onyeisi otu jikọrọ ndị ọkaiwu bụ Paul Usoro Otu jikọrọ ndị ọkaiwu na Naịjirịa bụ 'Nigeria Bar Association' adọọla aka na ntị ka ihe bere n'afọ 2019 ghara ibekwa na 2020. N'ozi afọ ọhụrụ ya, onyeisi otu ahụ bụ Paul Usoro gwara gọọmentị ka ha sepụ aka n'inupu isi na iwu obodo nakwa mkpebi ụlọikpe bụ nke e ji mara ha n'afọ gara aga. O kwuru sị: "N'afọ 2019, ndị ọchịchị leghara iwu Naịjirịa anya ugboro ugboro n'ihi nnupu isi na ọchịchị aka ike ha." Senate akagbuola nzukọ ha ka NBA malitere abụbụ ọrụ UN: Ọchụchụ Onnoghen dara iwu gbasara oke ruru mmadụ "Ọ bụ na 2019 ka e wepụrụ ọtụtụ ndị n'ọrụ na-esoghị ụzọ iwu kwuru." "Onye nke mbụ bu Okaikpe Walter Onnoghen e wepụrụ na mbido afọ 2019. Onye nke abụọ bụ onyeisi ụlọọrụ 'Corporate Affairs Commission' bụ Azuka Azinge." Usoro gbarụkwara ihu maka etu ndị uweojii nzuzo bụ DSS si wakpo ụlọikpe dị n'Abuja wee nwụchie Omoyele Sowore bụ ụlọikpe ahụ nyere iwu ka a tọhapụ ya. O kwuru na mmechi na "anyị na-atụ anya na gọọmentị ga-aga n'ihu irube isi na mkpebi ụlọikpe niile dị na Naịjirịa." Maka ndị Naịjirịa bi n'ofesi Abike Dabiri Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi mba ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa ekwuola na Ụlọomeiwu Naịjirịa kwesịrị ileba anya etu a ga-esi mee ka ụmụ Naịjirịa bi mba ofesi na-esonye na ntuliaka. Dabiri-Erewa kọwara na nke a bụ n'ihi na ndị bi mba ofesi na-enyere akụnụba Naịjirịa aka nke ukwu. O kwuru na gọọmentị etiti ga-agba ịhụ na nke a mezuru. Ọkụ na-agba n'Ọstrelịa Ọkụ ahụ agbapịala ọtụtụ ụlọ ma gbuo mmadụ iri na asatọ A dọọla ndị gara njem nlere anya na mpaghara ụfọdị na mba Ọstralịa ka ha kwara ngwongwo ha laa n'ihi ọkụ ọgbụgba na-agbasa n'ike n'ike. Ka ọ dị ugbua, mmadụ iri na asatọ anwụọla na ya bụ ọkụ ọgbụgba ebe ihe karịrị otu puku ụlọ na narị abụọ alaala n'iyi. Okụ a bidoro ịgba n'ọhịa dị icheiche kamgbe ọnwa Septemba afọ 2019. Nke mere na Kenya na Sudan Mmadụ iri atọ anwụola dịka ọgbaaghara dapụtara n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ n'obodo Dafur dị na mba Sudan . Nke a na-eme dịka ndị Al shabbab gburu mmadụ atọ n'ime ụgbọala ha ji eme njem n'obodo Lamu nke dị na mba Kenya. Arsenal emeriela Man Utd Pepe nyetere ofu goolu n'asọmpi ahụ Ọbịbịa Mikel Arteta dịka onye nkuzi ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal amalitela ịmịta mkpụrụ. Arsenal ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Manchester United n'abalị Wenezde. Manchester United so Arsenal alọ ka Ọgbọnọ Ọkpụkpụ agbadola Manchester United n'olu na Bournemouth Nke a bụ mmeri mbụ Arteta na-enweta kamgbe ọ malitere ọrụ n'Arsenal. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Akụkọ mere ugbua: Gọọmentị Kwara akụtuola ụlọ Saraki Ihe iri ị na-amaghị maka nwaada Amaka Igwe larala mmuọ Ihe mere na ndị Ugwu achọghị ka onye Igbo bụrụ onyeisiala - Nnamdi Kanu Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Egwuruegwu", "Australia", "Bọọlụ", "Bukola Saraki", "Kwara steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50976255
Liverpool ọ ga-akwụsị ịza 'Erọn gba aka' na Premier League n'afọ a?
Liverpool bute iko Premier League nke afọ 2019/2020 a, ọ ga-abụ mbụ ha na-ebute ya n'ime afọ iri atọ.
2020-01-03T12:28:37Z
Liverpool F.C: 2020 ọ ga-abụ afọ ha ga-emecha metụ iko Premier League aka?
Liverpool Ọ dị ka afọ 2020 a ga-abụ afọ Liverpool ga-emechi ndị na-akọ ha ọnụ maka ebuteghi iko Premier League. Ọ bụrụ na a mụrụ gị n'ihe dị ka site n'afọ 1989/90 ruo ugbua, mara na gị na mgbe ikpeazụ Liverpool metụrụ iko Premier League aka, bụ ọgbọ. Gịnị ka nke a pụtara? Ọ pụtara na ikpeazụ otu egwuregwu a buliri iko a, bụ afọ iri atọ gara aga (1989/90). Liverpool agwọọla Arsenal ka abacha e tinyere ose Nsukka Liverpool asụọla atịkpa fenye Tottenham ajụ n'anya Liverpool aghọọla 'sọ m bụ eze ga-akwụ ọtọ'? Ka a kwụ ugbua na tebulu Premier League, Liverpool chị ezigbo ọkụ bịa n'afọ 2019/2020 a, makana ha emeriela egwuregwu 19 n'ime 20 ha gbarala. Ebe ọ fọrọ egwuregwu 18 tupu afọ a emechie, ha mere etu a na-aga n'ihu, enweghị ihe ga-egbochi aka ha ibuli iko a. Ha enwetala pọịntị 58, ebe ndị na-eso ha n'azụ bụ Leicester City nwere pọịntị 45; nke bụ na ọ bụ pọịntị 13 ka Liverpool ji aga ha. Ọ bụ ọgwụ ka e mere ha ya eme? Ọ bụrụ n'ajụjụ a na-anụ gị ọkụ n'obi, i fughi ụzọ, n'ihi na ọ bụkwa ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ gbasara ihe mere na Liverpool ebutebeghi iko a. Mana ọ bụ na ha erubeghi nso imetụ ya aka? Ha agbalịala ibute ya bụ iko, mana iko ahụ na-eme ha ọnọ nso eru aka. Ugboro ole ha ruru nso ibute iko Premier League Ugboro ugboro ka Liverpool ruru nso imetụ iko a aka, nke kacha nso abụrụ n'afọ 2018/2019 mgbe Manchester City ji naanị otu pọịntị gafee ma pụchara iko ahụ n'ụbọchị ikpeazụ a pịachiri asọmpi Premier League nke afọ ahụ. Ha ruru nso imetụ iko a aka n'afọ 2013/2014, mgbe Manchester City napụkwara ha nri n'ọnụ. N'afọ 2001/2002, ha ruru nso ibute iko a, mana Arsenal buliri ya bụ iko ebe Liverpool gbara ndị nke abụọ. Otu ihe ahụ mekwara n'afọ 2008/2009, mgbe Manchester United ji naanị pọịntị anọ gafee ha ma bulie iko. N'afọ 1990/1991 ka ha rukwara nso ọzọ ka ha mabutechara ya bụ iko n'afọ 1989/90, mana Arsenal bụ ndị bu Iko ahụ laa. Liverpool buliri iko Champions League ọzọ n'afọ 2018/2019 Iko ole ha buterela n'ime afọ 30 a: Na ha ebutebeghi iko abụghịkwanụ na ha gba aka iko n'ime afọ iri atọ a (site n'afọ 1990 ruo 2019). Lee ndị ha butenwuru: Iko Champions League - Abụọ. Ha butere n'afọ 2004/05 na 2018/19 Iko FA - Atọ. Ha butere n'afọ 1991/92, 2000/01 na 2005/06 Community Shield - Atọ. N'afọ 1990, 2001 na 2006 Iko UEFA Europa League - Otu. N'afọ 2000/01 Iko UEFA Super Cup - Atọ. N'afọ 2001, 2005 na 2019 Iko FIFA nke klọb ndị meriri na mbaụwa - Otu. N'afọ 2019 Iko EFL/Carabao - Anọ. N'afọ 1994/95, 2000/01, 2002/03 na 2011/12 Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Egwuruegwu", "Premier League", "Liverpool F.C.", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50985241
E menyụọla ọkụ ọgbụgba n'ahịa Ogbete
Ume na obi ekutuola ndi mmadụ ala dịka e menyụrụ ọkụ bidoro ịgba ahịa Ogbete dị n'Enugwu n'ehihie Fraide.
2020-01-03T15:03:28Z
E menyụọla ọkụ na-agba ahịa Ogbete, Enugwu
Ahịa Obiagu Ọkụ gbaburu Ahia Obiagụ dịkwa n'Enugwu n'afọ E menyụọla ọkụ ọgbụgba dapụtara n' ahịa Ogbete dị n'Enugwu n'ehihie Fraide, ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị, 2020, tupu o mebie nnukwu ihe. Ndị nọ ebe ihe mere kwuru n'ọ bụ ọdọ ndị na-ere 'foam' ebe 'Railway' ka ya bụ ọkụ na-agba. Ọkụ agbagbuola Fada ụka Katọlik, a tọrọ ọzọ Ọkụ gbara obi ndị ọrụoyibo n'Anambra Gọọmentị Anambra amachiela gwongworo bu mmanụ ụgbọala ịgba n'ehihe Ụlọ na-agba ọkụ n'ahia Balogun, Legọs Otu onye n'ime ha kpọrọ onwe ya 'Nnadozie' kwuru na ọkụ ahụ bidoro n' igwe na-enye ọkụ latrik a dọwara n'elu ụlọ dị n'ahịa ahụ ma feesee n'ngwa ahịa ndị mmadụ kwasara n'elu ụlọ. Mana ndị ahịa menyụrụ ya ma kwụsị ya ịbanye n'ime ọdọahịa ndị mmadụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Liverpool ọ ga-akwụsị ịza 'Erọn gba aka' na Premier League n'afọ a? Etu ndi ji egbe siri gbuo mmadụ 19 na Kogi Qasem Soleimani: Lee ihe ndị kpalitere agha Mbaụwa mbụ na nke abụọ Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Enugu Steeti", "Ahịa", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50985233
Qasem Soleimani: Lee ihe ndị kpalitere agha Mbaụwa mbụ na nke abụọ
Ogbugbu AmLee na ihe ndị ị maghị maka Agha Mbaụwa Mbụ na nke Abụọ.
2020-01-03T17:44:14Z
World War 3: Lee ihe ndị kpalitere agha Mbaụwa mbụ na nke abụọ
Ọgbọ Agha Mbaúwa Mbụ Ogbugbu mba Amerịka gburu onyeisi agha mba Iran bụ Qasem Soleimani na mba Iraq akpaliteela egwu ma ọ ga ebute agha Mbaụwa nke atọ. Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na soshal midia n'arụ aka na ọ bụ ụdị ekweghị ekwe ụfọdụ mere mmiri jị banye opi ụgbọgụrụ nke butere agha abụọ ahụ. Ncheta World War 1: Etu agha a si metụta Afịrịka Lee ụfọdụ ihe ndị mere n'agha abụọ ahụ: Agha Mbauwa Mbụ(1914-19) Uwa niile enweela nkpebi na udi agha agaghị amalite ọzọ Ndị lụrụ ya: Agha mbaụwa Mbụ bidoro n'etiti mba Briten na mba Jamini n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1914. Mba Briten,Fransi na Russia kwụkọtara luso Jamani na Austria-Hungary na ndị na-akwado ha. Ihe butere okwu: Ọ bụ ịzọ onye ga-ewere obere mba ndị ọzọ bụ ihe butere ụka. Kedụ uru Nigeria ga-erite na mbuli ọnụego mmanụ agbịdị? Ndị agha Syria ekela Ghouta ụzọ atọ Oge ahụ ndị mba nwere agba dịka Briten,Russia na Jamini na-azọkọsị obodo ha ga-eweghara ọchịchị ha(colonies). Jamani na Austria-Hungary weghara mba Bosnia na Morocco nke were mba Briten Iwe ha were si na Jamini ji anya ike achụ ya bụ ihe. Agha Mbauwa Abụọ (1939-1945) Adolf Hitler bụ onyeisiala chiburu mba Jamanị chọrọ igbochapụ ndị Juu n'elu ụwa a Ndị lụrụ ya: Na mbụ naanị Briten na Fraansi bụ ndị nọ n'ọgụ ahụ Hitler kotere. Mana mba Amerịka sonyere n'agha ahụ oge mba Japan wakporo Pearl Harbour. Trump sị na Iran na-atụ 'asị ọcha' maka ndị CIA ha 'nwụchiri' Mba Amerịka, UK na Fransị awakpoola Sirịa Ogbunigwe Amerịka tụrụ na Hiroshima n'abali isii nke ọnwa Aụgụst afọ 1945 mere ka Japan chilie aka dịka onye e meriri emerị. O bụ n'agha ahụ ka Hitler gbalịrị ikpochapụ ndị Juu niile. Ihe butere okwu: Agha Mbaụwa nke Abụọ dara dịka Adolf Hitler wakporo mba Poland n'abalị mbụ afọ 1939. Mba Briten chere ha aka mgba ka abali abụọ gachara n'abalị nke atọ nke Ọnwa Septemba. Amerịka ebuliela mmachi ndị gbara ọsọndụ Onye bụ Abu Bakr al-Baghdadi? Agha Mbaụwa Mbụ na Nke Abụọ kpara mkpa mkpa dịka o butere agụụ,mbibi akụnaụba ma takwaa isi ọtụtụ mmadụ. Nke mere mba lụrụ ya jiri nwee nkweọkrịta na ha agaghị alụkwa agha ọzọ. N'agbanyeghị na a lụghị agha abụọ ndị a n'ala Afrịka mana ndị mba ofesi ndị nwere ọchịchị n'ala dị n'Afrịka dịka Naijiria dọrọ ụmụ afọ Afrịka gaa lụọ ya bụ ọgụ.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50997776
Ihe Bishop Katọlik gwara Mbaka maka amụma o buru n'isi Hope Uzodinma
Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ụka Katọlịk akatọọla amụma Fada Ejike Mbaka buru gbasara Imo steeti ụbọchị mbụ nke afọ 2020.
2020-01-05T07:04:13Z
2020 Prophecies: Ihe Bishop Katọlik gwara Mbaka maka amụma o buru n'isi Hope Uzodinma
Ụkọchukwu Ejike Mbaka Ụkọchukwu Ejike Mbaka Ụfọdụ ndị ụkọchukwu Katọlik na ndị ntorobia Imo steeti etinyela ọnụ n'ịkatọ amụma Fada Ejike Mbaka kwuru ebe ọ sị na Hope Uzodinma zọrọ oche n'okpuru APC, ga-eweghara ọchịchị steeti ahụ n'afọ a. Bishop dayọsis katọlịk dị n'Ụmuahịa bụ Luscious Ugorji kwuru na ụka katọlịk ebe Mbaka bụ ụkọchukwu "anaghị agba afa ka ndị dibịa". Amụma Mbaka maka Hope Uzodinma, Buhari ekwuola okwu, bịa gere ozi ndị ọnụ na-eru n'okwu Ọkpụrụkpụ okwu 20 Fada Mbaka kwuru maka Naijiria, Buhari, ndị gọvanọ, ndị uweojii "Nke mere na ha adịghị enye ndị ụkọchukwu ha ikike ikpebi onye ga-emeri n'ikpe dị n'ụlọikpe." dịka ụlọ mgbasaozi "Sun newspaper" si depụta. N'otu aka ahụ, ndị ntorobia nke Isdore Chukwuemeka na-anọchiteanya ha, kwukwara sị ka Mbaka hapụ gọvanọ Emeka Ihedioha aka n'ihi na ndị mmadụ tụnyeere ya makana ọ masịrị ha, ma kwuo na ọrụ Ihedioha na-arụ n'Imo masịrị ha. A gba m aka ka m gbuchara enyi m nwaanyị: Adeeko Owolabi bụ nwataakwụkwọ dị afọ iri abụọ na atọ e jidere maka iso kpaa nkata igbu enyi ya nwaanyị, ekwuola na ọ hụghịdị ihe o ji maka ya kpaa arụ a. Owolabi kwuru na o gburu Favour enyi ya nwaanyị ka o jiri ya gwọọ ọgwụ ego, mana ka ọ gwọchara ya bụ ọgwụ, o jighi rose, o jighi ndawịị. Ọkụ gbara n'Ọyọ steeti Foto a si n'ahịa Timbershed gbara ọkụ n'Enugwu n'afọ 2019 Ọkụ agbapịala ngwongwo ndị mmadụ ruru nde kwuru nde naịra n'ahịa dị n'obodo Akesan dị n'Ọyọ steeti. Ka ndị mmadụ na-ewe iwe ọkụ ọgbụgba ahụ, mgbọ tụrụ otu nwatakịrị dị afọ iri na anọ ebe ahụ, kama ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha na-achọ onye gbapụrụ mgbọ ahụ makana o sighi n'aka ndị otu ha. Ọkụ na-agba n'Ọstrelia Ọkụ na-agba na New South Wales Ndị mmadụ atụkọtala nde dọla iri na atọ n'ime ụbọchị abụọ, a ga-eji nyere aka menyụọ ọkụ oke ọhịa na-agba n'obodo New South Wales dị na mba Ọstrelia, dịka onye ọkpaọchị a ma ama bụ Celeste Barber rịọrọ arịrịọ. Ọkụ a ataala isi ihe ruru mmadụ iri abụọ na anọ ma chụpụ ihe karịrị puku iri abụọ n'ụlọ kemgbe ọ malitere. N'egwuregwu, Liverpool na Everton ga-ezute ọzọ n'ọgbọegwuregwu Anfield ebe ha abụọ ga-ama aka ịmata onye ga-epiobanye n'agba nke anọ n'asọmpi Iko FA. Ndụmọdụ maka oke ụgụrụ na-ekunu? Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs steeti, adụọla ndị mmadụ ọdụ ka ha gbado anya iji gbochie ọkụ ọgụgba n'oge ụgụrụ a. Na ndụmọdụ ya, o kwuru sị ka ndị mmadụ cheta na-agbanyụsị nakwa kwụpụta ihe ndị na-eji ọkụ latrik arụ ọrụ ma ha na-apụ apụ, nakwa gbaa mbọ nwee ihe e ji emenyụ ọkụ nke bekee kpọrọ extinguisher. Trump ka na-aba mba? Donald Trump bụ onyeisiala mba Amerịka ekwuola sị na mba ya na-ede ọdọ iri ise na abụọ dị na mba Ịran ha ga-ebu ọgụ agakwu ma ọ bụrụ na Tehran buru ụzọ wakpoo ndị Amerịka. Trump kwuru na Amerịka achọghị mmaja ọzọ sitere n'aka ndị Ịran, ma ọ bụghị ya, ha agaghị egbu oge iwakpo ha ebe ọ ga-eru ha n'ọkpụkpụ. Onye ka ike ga-agwụ? Chelsea na Nottingham Forest ga-akwata ya na Stamford Bridge taa, ịmata onye ga-agafe na onye ga-efere asọmpi FA aka, dịka a na-akwado ibanye agba nke anọ. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Amerika", "Oke Ihu Igwe", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51000880
'Gọvanọ Okezie Ikpeazu akpọghị IPOB otu oyiegwu'
Gọọmentị Abia Steeti ekwuola na ọ bụ ndị chọrọ ka ọgbaaghara dị n'Abia steeti bidoro akụkọ ugha na-ewu.
2020-01-05T16:00:39Z
Gọvanọ Okezie Ikpeazu akpọghị IPOB otu oyiegwu- Abia State
Okezie Ikpeazu Gọọmentị Abia steeti ekwuola na akụkọ na-efegharị nke sị na gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu kwuru na ya achọghị ndị oyi egwu bụ Ipob na steeti ya bụ asi. Ọnụ na ekwuchitere gọọmentị Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka kwuru na ọnweghị mgbe Ikpeazu jiri kwuo ụdịrị okwu a ma ọ bụ na nzụzọ ma n'ịhu ọha mmadụ. O kwuru sị na dịka ọnụ na ekwuchitere Abia steeti ma sị na enweghị mgbe Gọvanọ Abia steeti jiri kwuo ụdịri okwu a. Ememanka kwuru na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ajụrụ ajụ oge emere ntụlịaka bidoro akụkọ ụgha a. O kọwakwara na ndị ndọrọndọrọ ọchịchi a bị na Legos steeti ma sị kwa na ụche obi ha bụ ibute ọgbaaghara na Abia steeti. Na Benue Steeti Ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị Benue bụ Shehu Tambaya akpọkuola gọọmetị etiti ka ha hapu ịkpọlata ndị agha na-echekwa ebe dị iche iche na Naijirịa. Tambara kwuru nke a ma sị ọkachasị Benue steeti ebe ndi mmadụ bi na ogige gbata gbata maka nwakpo ndị ọchi ehi na awakpo ha n'ime obodo. N'Ofesi Ọ bụkwa otu Alshabab wakpro ọdọ ahia 'West Gate' were gbuo mmadụ iri isii na asatọ n'afọ 2013 Ndị oyi egwu bụ Al shabaab awakpoola ọgịge ndị agha Kenya na nke mba Amerịka dị na Obodo Lamu na Kenya. Ha mebiri otutu ụgbọelu na ụgbọala tupu ndị agha mba Kenya were chụpụ ya. N'egwuregwu Otutu ndị ọhụrụ ka Liverpool ji gbaa asọmpị a Na FA Cup taa; Ndị otu egwu bọọlu Chelsea achịrila aja nwunye ndị Nottingham forest n'ọnụ dịka ha jị ọkpụ goolu xxx asataghị ma ncha were merie ha na asọmpị FA cup ebe Liverpool ji otu ọkpụ goolu were kpaa ndị otu Everton Eze. Akụkọ ga-amasị gị Ihe Bishop Katọlik gwara Mbaka maka amụma o buru n'isi Hope Uzodinma Cardi B emetela ihe eji kpụrụ Nigeria n'ọnụ ọzọ Ọgbọ gaasị gbawara ka ogbunigwe egbuola ndị mmadụ na Kaduna Aka DSS akparala onye 'meputara' ihe onyonyo ụgha maka agbamakwụkwọ Buhari
[ "Naijiria", "Abia Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51005225
NERC ebulibeghị ụgwọ ọkụ latrik ọbụla
Ụlọọrụ NERC kwuru na ha na ndị mmadụ na ndị na-arụpụta ihe ga-akpa tupu ha ekpebie n'ihe gbasara ụgwọ ọkụ.
2020-01-06T19:52:54Z
Electricity tariff: NERC ebulibeghị ụgwọ ọkụ latrik ọbụla
Igwe ọkụ latrik Ụlọọrụ na-ahụ maka nkesa ọkụ na Naịjirịa bụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (Nerc), ekwuola na enwebeghi mgbanwe n'ụgwọ ọkụ ndị Naịjirịa ga na-akwụ. Ha kwuru na ihe ha biputara na-egosi ụgwọ a ga na-akwụ n'afọ 2020 a, bụ nke na-egosi ihe iwu nagidere ha ị na-eme dịka ndị na-ekesa ọkụ latrik. PHCN kwesịrị inye gị ọnwa atọ tupu ha achabie ọkụ - Ọkaiwu 'Itinye ego mgbazite n'ọkụ latrikị abụghị ihe kacha mkpa ugbua' James Momoh bụ onyeisioche ngalaba Nerc kwuru na ha na-eme mbiputa a ugboro abụọ n'afọ, na ha emeela nke mbụ n'ọnwa Juun, ga-emekwa ya na Jenụwarị a, n'ihi na ọ bụ ọrụ ha. O kwuru na n'ime ihe dị ka ọnwa atọ na-abịa, na ha ga ekwuputa ihe ha ga-achọpụta na ngagharị ha ga-eme; na ọ bụrụ na ha mechaa nzukọ ndị a kwuo na 'a gaghị etinyekwu ego", ọ pụtara na agaghị enwe mbulie ụgwọ ọbụla. "Mana ọ bụrụ na a ga-etinyekwu ego, ọ ga-abụ maka ihe anyi kwutere na nzukọ". "Anyị ga-agbasa ozi ga-akọwa ihe anyị kpebiri na nzukọ a, n'ụzọ onye ọbụla ga-aghọta, iwepụ mgbagwoju anya si na nke anyị biputaburu mbụ. "Anyị na ngalaba na-ahụ maka nrụpụta ihe bụ Manufacturers Association of Nigeria nakwa ndị na-amụ ọkụ latrik ga-ekpebi tupu anyị ekpebie." Kedụ ebe ndị bi n'Enugwu steeti kwụ gbasara ịkwụ N40,000 maka mita ọkụ latrik? Ndị bi n'Enugwu steeti arịọla ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ụlọọrụ 'Enugu Electricity Distribution Company' (EEDC) na-agwa ha ka ha kwụọ puku iri anọ maka inweta mita ọhụrụ. Ha kwuru na ha amaghi ebe ha kwụ akwụ n'okwu a, dịka EEDC bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ịkesa ọkụ latrik, gwara ha cheretu, oge ha gara ịkwụ ụgwọ ọkụ ha. EEDC: Anyị akpaghị mita ọkụ aka Gọọmentị na ndị Discos na-ama aka onye mere Naịjirịa ejighi nwee ọkụ PHCN kwesịrị inye gị ọnwa atọ tupu ha achabie ọkụ - Ọkaiwu Ha kwuru sị na ndị EEDC kwuru na ha ga-abịa wepụ mita nke ochie, tinye nke ọhụrụ tupu ndị mmadụ amalite ịkwụ ụgwọ a, nakwa ụgwọ ọbụla ha ji. Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo ka na-agbalị inweta onyeisi ndị EEDC n'ekwentị. Ọkụ agbagbuola nwa akwụkwo n'Ọnịcha Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na ọ bụ eziokwu na nwatakịrị dị afọ iri na otu nwụrụ n'ọkụ gbara n'ụlọakwụkwọ obibi Patterson memorial Grammar school di n'Ọnisha. Haruna kwuru na ha ka na-enyocha ịma ihe bidoro ọkụ ahụ gbara n'abalị ụbọchị ise nke ọnwa Jenụwarị a, ka ụmụaka ka si ịgba ekeresimesi lọta akwụkwọ. Mwakpo mahadum dị n'Indịa, Ụmụakwụkwọ si ụlọakwụkwọ dị iche iche na mba India pụtara ime ngagharịiwe maka mwakpo a Ụmụakwụkwọ ndị mba India na-eme ngagharịiwe iji kwugide mwakpo ndị bu osisi wakporo ụmụakwụkwọ ibe ha na mahadum Jawaharlal Nehru dị n'obodo Delhi, ụbọchị ụka. Ha na-eme nke a ka ihe ruru ndị nkuzi nakwa ụmụakwụkwọ iri anọ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ maka ihe e tiri ha. Ịkpa oke agbụrụ n'egwuregwu, Mario Balotelli enyerela Brescia goolu ise n'asọmpi Serie A n'afọ a Mario Balotelli sị ihere megbuo ndị na-akwado Lazio dị ka ha kwara ya emu ịkpa oke agbụrụ ka ha na Brescia zutere. Ihe mere ụkọchukwu ji sụgbuo nwunye ya ma onwe ya n'elu ọlta Otu ụkọchukwu egbuola onwe ya ma sụgbuo nwunye n'elu ọlta ka ha na-aka ụka ụbọchị Sọnde. Di na nwunye a bụ ndị hibere ụlọụka ahụ dị na Mombasa, Kenya. Agụiyi adọgbuola ụkọchukwu 'E si na mba Kamerun wee zubata ọdụm a hụrụ n'ụlọ anyị'- Onye nche Ndị ụlọozu ga-agba ụkọchukwu 'kpọlitere onye nwụrụ anwụ' akwụkwọ Ndị ụlọụka ahụ kwuru na Elisha Misiko bụ ụkọchukwu ahụ, nọkatara n'ihu oche tupu o mechaa gaa n'ebe nwunye ya bụ Ann Mghoi nọ n'elu ọlta, were ọtụtụ mma o zoro n'okpuru akwa ya sụkasịa nwunye ya ahụ. Ka o mechara nke a, o were mma ahụ sụọ onwe ya n'afọ ma bewa akpịrị ya mgbe ndị ụlọụka ji ọsọ gbata n'ọlta. Ọ nwụrụ ebe ahụ ozugbo ozugbo mana nwunye ya nwụrụ n'ụlọọgwụ. Di na nwunye a agbasaala kemgbe ma na-ese okwu onye ga-abụ onyeisi ụlọụka ahụ dịka ụlọ mgbasaozi Daily Nation newspaper si depụta. Ndị hụrụ ebe ihe a mere kọwaara ndị ntaakụkọ ka o si mee. Ndị isi okpuruọchịchị nọ n'Imo steeti ga-alaghachite ọrụ taa Mmadụ 27 bụ ndị isi oche okpuruọchịchị dị icheiche n'Imo steeti ga-alaghachi ọrụ taa. Ọ bụ ụlọikpe kachasị nyere ha ikike a site na mkpebi ya na ndị gọvanọ na onyeisiala enweghi ikike ịmanye aka n'ihe gbasara okpuruọchịchị. Cheta na gọọmentị Imo kwụsitụrụ ha ọrụ n'ọnwa Juun n'afọ 2019. Na Kaduna, Ọnụ ọgụ ndị nwụrụ na gaasị gbara na Kaduna eruola isii dịka ndị uweojii nọ na steeti ahụ si depụta. Ha kwukwara na ngwongwo karịrị nde naira iri na isii bụ ihe furu n'ọkụ ahụ. N'egwuregwu, Otu egwuregwu Arsenal na Leeds ga-akwata ya na mgbede taa dịka egwuregwu FA Cup na-ebiri ọkụ. Bịa lee akụko iribama maka nwoke kpuru isi na-arụ egine dị iche iche na webụsaiti anyị bụ bbc igbo.com. Okwu Quasem Soleimani ka na-aga Dịka ọgbaghara na-ada n'ihi ọnwụ ọchịagha Quasem Soleimani n'aka ndị agha Amerịka, Onyeisiala Donald Trump eforola ntutu taa na aka ike ya ga-adakwasị mba Iraq maọbụrụ na ha chụpụ ndị agha Amerịka nọ n'ala ha. Okwu Trump na-abịa dịka ndị omeiwu Iraq na-agwa ndị agha Amerịka si mba ha kwara lawa. Igwe mmadụ gbakọrọ n'ụzọ Tehran bụ isi obodo Iran maka akwamozu onyeisi agha ha bụ Qassem Soleimani. Soleimanị nwụrụ ka ogbunigwe nke Onyeisala US bụ Donald Trump si ka atụọ dara n'Iraq. N'otu aka ahụ, onyeisi ndị uweojii bụ Mohamed Adamu agwaala ndị otu ya dịrị njikere maka ọgbaghara ọbụla nwereike ịdapụta maka ọnwụ ọchịagha Iran bụ Quassem Soleimani. Okwu ya bịara dịka ọ nụrụ kepu kepu na ọtụtụ otu dị icheiche na-akwado ịme ngagharịiwe maka ogbugbu mba Amerịka gburu Soleimani. Tunde Bakare adụọla Buhari ndụmọdụ Ụkọchukwu bụ Tunde Bakare agwaala onyeisiala Muhammadu Buhari ya tinye anya n'onye ga-anọchi anya ya. O kwuru na ọ bụrụ na Buhari bu ọdịnma Naịjirịa n'obi na o kwesiri ị hazi onye ga-anọchi anya ya n'ọkwa. N'egwuregwu, Enyimba FC nwetara ihe nrite dịka 'otu kachasị agba' na mpaghara Afrịka n'afọ 2003 Enyimba nke Aba na-achọ ikuru ume ndụ dịka Plateau United fọjuru ha goolu afọ mgbe ha zutere n'asọmpị Oriental Derby Ọ bụ goolu anọ ka e ji merie Enyimba. Gee akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a: Ihe onyonyo ga-amasị gị
[ "Naijiria", "Iran", "Amerika", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51018108
Enugu na steeti ndị ọzọ kachasị chọọ ihe 'nkiri 'gay' na 'Lesbian' na 2019
Enugu, Imo na Anambra bute ụzọ na steeti ndị kachasị chọọ ihe nkiri ndị "gay' nakwa nke Lesbian n'afọ 2019.
2020-01-07T11:33:55Z
Porn sites: Enugu na steeti ndị ọzọ kachasị chọọ ihe 'nkiri 'gay' na 'Lesbian'
Pornu Enugu, Imo na Anambra so na steeti ndị kacha chọọ ihe nkiri "Gay" nakwa "Lesbian" n'afọ 2019 dịka "Google search trends" nke 2019 si gosipụta. Ebe Bayelsa, Enugu nakwa Edo so na steeti ndị mbụ kachasị chọọ ihe gbasara mmekọ nwaanyị n'afọ 2019 na Naịjirịa. Lee tebụlụ ya ebe a na ogo pasenti ya. Steeti ndị kacha chọọ ihe nkiri 'gay' (Source: Google Search Trends 2019) Naịjirịa bu ụzọ n'obodo kacha achọ ụmụ nwaanyị buru ibu gba ọtọ - 'PornHub Insights' Naịjirịa bụ obodo e ji oke ikpere chukwu mara mana ọ kana gbagọjụ ndị mmadụ anya etu ha si bute ọzọ na mba kachasị ekiri ụnwaanyị gba ọtọ n'ọbaozi PornHub. Ụlọọrụ Pornhub wepụtara ozi a na webụsaitị ha ka ha na-eme nchịkọta ndị ka wee chọta webụsaitị ha n'afọ 2019. Ihe 5 ndị nwere ọtụ kwesiri ịma Ihe ndị bu ọtụ na amụ na-agabiga Ha depụtara na Naịjiria bu ụzọ na mba kachasị chọta ụmụwaanyị buru ibu na-agba ọtọ na webụsaiti ha n'ọnwa Maachị n'afọ 2019 , ebe Ghana , Kenya na Egypt na-eso ha n'azụ. PornHub kwukwara na ndị mmadụ agaghị na webụsaitị nnukwu n'oge ezumike. Gịnị kpatara nke a? Ọkammụta Mmirimmasinachi Ekechukwu na-ahụ ihe gbasara maka mmekọrịta ahụ kwuru na ụmụ Naịjirịa na-emekarị mara mara n'ihu gwọmpọtị n'azụ. O kwuru na o nweghị ihe mmapụ obi dị na ya makana nwoke maọbụ nwaanyi nwere ebumnuche ha nwere wee na-aga na ya bụ webụsaitị. Mana agwa ndị nsọ ụmụ Naịjirịa meziri ka ọ dịka nchọpụta ọ bụ arụ. Gbasara akụkọ kwuru na ụmụ nwaanyị kachọ mmekọrịta nwaanyị na nwaanyị ibe ha na webụsaiti ahụ, Ekechukwu kwuru ihe a riri ya ọnụ. Mana o kwuru na o nwereike ị bụ obi mgbawa ụmụnwoke na-enye ha butere nke a. Ọ rịọrịọ ka ụmụ Naịjirịa kwụsị mara mara n'ihu gwọmpọti n'azụ. Akụkọ ga-amasị gị Mmadụ 596 nwụrụ anwụ ka na-eri ụgwọ ọnwa na Bauchi Ihe Bishop Katọlik gwara Mbaka maka amụma o buru n'isi Hope Uzodinma Cardi B emetela ihe eji kpụrụ Nigeria n'ọnụ ọzọ
[ "Naijiria", "LGBT", "Mmekọ nwoke na nwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51005229
Ihe Tinubu kwuru maka 2023, Buhari na 'third term'
Onye ndu otu APC bụ Bola Ahmed Tinubu ekwuola na onyeisiala Buhari enweghị oebunobi ọbụla ịsọ oche ahụ nke ugboro atọ.
2020-01-07T12:27:51Z
2023 Presidency: Ihe Tinubu kwuru maka 2023, Buhari na 'third term'
Ahmed Tinubu Onye ndu otu APC bụ Bola Ahmed Tinubu gara zute Onyeisiala Naijiria bụ Muhammed Buhari n'obi gọọmenti etiti bụ 'Aso Rock n'ehihie Tuzde, were kwuo na Buhari enweghị ebumnobi ọbụla ịzọ oche ahụ nke ugboro atọ. O kwuru na ndị ọbụla ha na Buhari rụkọrọla ọrụ mara na ọ gaghị akpa iwu Naijiria aka iji nweta ohere ịchị agba nke atọ (Third Term) Tinubu: Amaghị m maka ọrụ APC enyere m 'Edemede Obasanjo bụ egwuregwu ndọrọndọrọ' Ọ gara n'ihu kwuo na chi ka bụ ụtụtụ ikwu maka onye ga-abụ onyeisiala n'afọ 2023. Inec, gbaa mbo mee mmeju ntuliaka kwụ ọtọ- Buhari Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari enyela Inec iwu ka ha gbaa mbọ hụ na mmeju ntuliaka ndị enwere gara nke ọma, na-enweghị wuruwuru ọbụla. Buhari nyere ntụzịaka oge Yakubu du ndị ọrụ ya gara leta Buhari nobi Gọọkmenti ụbọchị Tuzde. Buhari kwuru sị : A kwụsiri m ike na nkwado ntuliaka kwụ ọtọ. Ụmụ Naịjiria kwesịrị iwe ohere ịtụnyere onye masịrị ha na enweghị tigbuo-zọgbuo ọbụla." Inec gbara onyeisiala ama na e kpechaala ikpe niile gbasara ntuliaka ndị kwesịrị ibi n'ụlọikpe mkpegharị. Cheta na e nwere steeti ebe a ga-ementuliaka nakwa mpaghara a ga-enwe mmegharị maọbụ mmeju ntuliaka. Onye gbagburu onye nwụrụ n'ọgbaghara dapụtara n'Imo steeti? Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha na-esi imi n'ala ịmata onye gbapụrụ egbe gburu otu onye ka ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị na-azọ oche ọchịchị imeobodo na steeti ahụ. Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Orlando Ikeokwu, gwara BBC Igbo na ọgbaghara a dapụtara ka ndị isioche okpuruọchịchị imeobodo 27 e wepụburu ewepụ gara n'okpuruọchịchị ndị ahụ kwuo na ha chọrọ iweghara ọchịchị. Ha gbadoro aka na mkpebi ụlọikpe kachasị nyere n'isi Ekiti steeti, wee gaa iweghara ya bụ ọchịchị n'ihi na ha chere na ọ bụ otu mkpebi ahụ metụtara ha; mana ha zutere ndị uweojii bịara ịhụ na ihe niile gara n'anya ya - na-enweghi nsogbu ọbụla. Mana nsogbu dapụtara ka ndị jibu ọchịchị na ndị a bịara ịnara ọchịchị malitere ise okwu n'okpuruọchịchị Isu, a gbaa mmadụ abụọ egbe, mana otu onye nwụrụ ka e bugara ha ụlọọgwụ. Ikeokwu kwuru na ndị nke Imo steeti echeghi ka mkpebi ikpe nke ha pụta n'ụlọikpe, tupu ha azọwa onye ga-anọ n'oche, nke bụ ihe butere ọgbaghara a. N'etiti ndịagha na Gọvanọ Babagana Zulum Ndị agha Naijiria asaala Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum okwu n'ebubo o boro n'ihe onyonyo fegharịrị na nso nso na ndị agha na-ana aka azụ n'okporoụzọ ma kwuo na ha ga-ama imi n'ala inyocha ndị mere ya bụ ihe. N'otu aka ahụ, ha rịọrọ ka onye ọbụla nwere ụdị mkpesa ahụ kpọtụrụ ha, kama ịgba ha otele n'anwụ etu ahụ. N'ofesi, Igwe mmadụ nuputara n'ụzọ n'obodo Kerman dị na mba Ịran, ịkwa ozu Soleimani Mmadụ iri anọ anwụọla ka ndị mmadụ na-ekwo ekwo ebe ha pụtara akwamozu Qasem Soleimani, bụ ọchịagha ndịagha Qud Force nke onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nyere iwu ka e gbuo, na mba Ịran. Egwu ga-ada na Manchester Pep Guardiola ekwuola na enweghi ihe ga-eme ka ọ chịkọta ndị Manchester United maọbụ Real Madrid. Nke a na-abịa dịka Manchester City bụ ndị ọ na-achịkwa, na Man Utd ga-akụkọta mpi n'Iko Carabao n'abalị Tuzde a. Nwaanyị akwanyela nwunye di ya na nwa ọ kwọ n'azụ n'ime olulu mmiri Ndị uweojii na Kano anwụchiela otu nwaanyị Hauwa Lawal kwanyere nwunye di ya na nwa o ku n'aka n'ime olulu mmiri. Ndị uweojii kọwara na ọ bụ esemokwu ezinaụlọ ka o ji kpaa mkpamkpa ahụ. A kpọpụtara Zuwaira Sani n'olulu ahụ mana o mechara nwụọ n'ụlọọgwụ ebe nwa ya nwoke natara ọgwụgwọ. Ndị Naịjirịa ọ bụ gịnị? Ị ma na aha Naịjirịa pụtara dịka obodo kachasị e le ndị na-enwe mmekọ n'Intaneti dịka ụlọọrụ Pornhub si kwuo. Onye ọkammụta n'ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị ekwuola na ụmụ Naịjirịa na-eme mara mara n'ihu gwọmpịtị n'azụ. Gụọ ya n'uju ebe a: Lee ọkwa Naịjirịa nọ n'obodo ndị kacha achọ ụmụnwaanyị gbaa ọtọ N'ofesi Ihe karịrị mmadụ iri atọ anwụọla na nzogbu nzogbu malitere n'akwamozu Qassem Soleimani bụ ọchịagha mba Iran. Cheta na Soleimani nwụrụ mgbe ogbunigwe mba Amerịka zipụrụ tụrụ ya. N'egwuregwu, Ngalaba na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF n'aha ịchafụ ebunyela ọgba bọọlụ Super Eagles Success Isaac ụkpa ekele dịka taa bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya. Gọọmentị Bauchi steeti ekwuola na ha chọpụtara ihe karịrị mmadụ nari ise nwụrụ anwụ ka na-anata ụgwọ ọnwa na steeti ahụ. Ha kwuru na nke a gbara n'anwụ mgbe ha malitere ịme nyocha ndị ọrụ na Bauchi steeti. Ndị uweojii n'Enugwu ji ike na ebube achụ ndị otu ọjọọ ọsọ n'Enugwu Ndị uweojii n'Enugu anwụchiela ndị otu ha atọ nke a hụrụ n'ihe onyonyo ebe ha na-enye otu onye ntorobịa nsogbu maka ekwentị ya. Ha kọwara na ha ga-ekpe ha ikpe imeụlọ ma kwuo na ndị uweojii anaghị akwado mwakpo ndị mmadụ n'ụzọ ọbụla. Anyị kwụ chị m n'Iraq! Ọ bụ gọọmentị mba Amerịka ebe ha na-agọpụ aka na ụkwụ ha n'akwụkwọ ozi na-efegharị na-ekwu na ha na-achọ ịkpọpụta ndị agha ha ebe ha nọ na mba Iraq. Cheta na ndị omeiwu mba Iraq na-akpọ oku ka ndị agha mba Amerịka kwara laa n'ihi ọgbaghara ha sunyere na mba Iran dị n'akụkụ ha. Ọ dị ka Arsenal ekuliela n'ụra ugbua Ha ji otu ọkpụ goolu merie Leeds mgbe ha zutere onwe ha n'agba nke atọ n'asọmpị Emirates FA Cup Ha ga-ezute Bournemouth n'agba ọzo n'Abia. Gee akụkọ n'ime otu nkeji ebe a
[ "Iraq", "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51018109
Iran vs US: Britein ekeela nkwụcha
Mba Briten adọọla ndị bee ha chọrọ ịbịa Naịjirịa n'oge a aka na nti ha kpachapụ anya ebe ha na-aga maka ọgbaghara nsogbu dị n'etiti US na Iran nwereike ibute.
2020-01-08T05:50:40Z
Iran vs US: Britein ekeela nkwụcha
Dịka nsogbu dị n'etiti Iran na mba US na-akawanye njọ, mba Britein adọla ndị ala ha chọrọ ibia Naịjirịa aka na nti ka ha mụrụ anya dịka azụ n'ihi ihe egwu maọbụ ọgbaghara nwereike ịdapụta. Ha gwara ha zere ebe a na-eme ngaghariwe maọbụ ebe e nwere igwe mmadụ. Ndị Nigeria bi USA a na-atụ ụjọ na agha nwereike ịda? Qasem Soleimani: Lee ihe ndị kpalitere agha Mbaụwa mbụ na nke abụọ Sadio Mane na Asisat Oshoala turu ugo CAF 2019 Sadio Mane na-agbara otu Liverpool nakwa Senegal bọọlụ eritela nturugo dịka ọkaibe Confederation of African Football's (Caf) nke afọ 2019. Ọ piakasiri ndị dịka Mohammed Salah bụkwa onye otu Liverpool ibe ya nakwa Riyad Mahrez nke Manchester United were maburu ya bụ nturugo. World Cup 2018: Lee mmadụ ise riterela 'Golden Boot' n' Iko Mbaụwa ise Ihe niile a gbatara na Premier League na Sunday Mane dị afọ iri abụọ na asaa nyere ndị otu egwuregwu Liverpool aka mabanye na ọkwa Champions League nke 2018-2019 ma nyezuo goolu ruru iri atọ (30) n'asọmpị niile agbara n'izu gara aga. Ọ natara nturugo na mmemme ahụ nke e mere na Hurghada, Egypt mana ndị ya na ya zọrọ ya dịka Salah na Mahrez abịaghị mmemme ahụ. Nigeria agbaghị 'last' dịka Asisat Oshoala turu ugo ọkaibe Caf n'ogo ụmụnwaanyị. Ọ kwaturu Ajara Nchout bụ ọgba bọọlụ Kamerun nakwa Thembi Kgatlana nke South Afịrịka wee maburu ya bụ nturugo. Gere akụkọ ụwa na nkeji Ihe nkiri taa
[ "Naijiria", "Senegal", "Ọka ibe n'egwu bọọlụ Afirịka n'afọ", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50991763
Ndị Nigeria bi USA a na-atụ ụjọ na agha nwereike ịda?
Dịka Amerịka na Iran na-ama onwe ha aka kamgbe Amerịka gburu ọchiagha ha, Kedu ihe ndị Igbo bị na Amerika Chere?
2020-01-08T07:14:23Z
USA and Iran: Ndị Nigeria bi USA a na-atụ ụjọ na agha nwereike ịda?
Ndị na-eme ngaghari iwe Ebe niile na Sọshal Midịa ka akụkọ agha na-etiti mba Amerịka na mba Iran. BBC jụrụ ndị Igbo bi na Amerịka etu ndụ ha sịrị dị kamgbe kepukepu magha bidoro dawa. Trump sị na Iran na-atụ 'asị ọcha' maka ndị CIA ha 'nwụchiri' Nwaada Betsy Njemanze gwara BBC na ndụ ka dịkwa etu ọdi bu na Amerịka na ọnweghị onye na akụja. Kama ọ kọwara na ọ bụ ndị ụmụ ha sọ na ndị agha mba Amerịka kaọ na eche uche. 'Ọ bụ ndị ụmu ha so na ndị agha Amerịka ka uche na eche' Betsy Njemanze O kwukwara na otutu ụmụnwoke sitere na steeti ebe o bi bụ 'North Carolina' agawala mba Iraq ilu ọgụ. Nkea bidoro kamgbe egburu ochiagha ndị mba Iran bụ Qasem Soleimani. Ihe atụmatụ 'Impeachment' Trump pụtara Onye bụ Abu Bakr al-Baghdadi? N'otu aka ahụ ka Charlse Mbamara onye bị na obodo 'Atalanta' kwukwara na onye ọbụla na agara nke ya. Ọ kọwara na ndị mba Amerịka kwenyere na onweghị ihe ndị mba Iran ga-eme ga erute ha n'ihi na atụmatụ nchekwa ha siri ike. Ọ sị na kamgbe 9/11 ndị mba Amerịka ejighịzị nchekwa ha egwu egwu.
[ "Naijiria", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51000888
Etu ị ga-esi zọọ ndụ gị oge ụgụrụ a
Ihe ụgụrụ bụ bia karịrị oyi na uzuzu, akụkọ a na akọwa etu ị ga esi chekwa onwe gị maka ihe ndị ọzo ha na ụgụrụ so abia.
2020-01-08T15:42:03Z
Harmattan: Etu ị ga-esi zọọ ndụ gị oge ụgụrụ a
Ụgụrụ Oge ọkọchị ọkachasị mgbe ụgụrụ dị bụ oge ụfọdụ nje na ọrịa dị iche iche na abụta ihe. Oge ụgụrụ na ebidokarị site n'ọnwa Nọvemba rụọ nke Machị. Gịnị ka ị ma maka ọrịa 'Pneumonia'? Ị ma na ọ bụghị oyi na-ebute Pneumonia? Ụgụrụ na-ebu oke uzuzu,oyi na ahụ ikpo nkụ. Otutu ndị mmadụ na-eji ụzọ di iche iche echekwa ọnwe ha mgbe ụgụrụ mana ụfọdụ ụzo ndịa ezighi ezi. Dọkinta na-ahu maka anụ ahụ na ahu ike bụ Chidinma Okafor kọwara etu ị ga-esi chekwa onwe gị n'oge ụgụrụ. Ihe na eso ụgụrụ abịa Chidinma Okafor kọwara na ụgụru bu oge ikuku na-ebu nje ọrịa dị iche iche efegharị. O kwukwara sị na 'ụgụrụ na-ebute kwa oyi na ahụ ịkpọ nkụ maka na ụgụrụ na amịkpo mmiri di n'anụ ahụ'. Gịnị ka ị ma maka ọrịa 'Pneumonia'? Ọrịa Lassa Fever emefuola mmadụ atọ n'Ebonyi Ahụ ịkpọ nkụ a na emezi ka obere ihe bute ọnya n'ahụ. Kedu ọrịa na-eso ụgụrụ? Ụfodụ nje dịka Diahorrea anaghị adịkarị oge ụgụrụ. Nje na ebute ụkwara nta Ya bu na ọrịa a na-ebute na mmiri anaghị adịkarị. Kama ọrịa dịka ụkwara nta (tuberclosis) na enye nsogbu oge ụgụrụ. Etu ị ga-esi chekwa onwe gị n'oge ụgụrụ. Ụlọ obibi ọbụla kwesiri inwe ebe ikuku si apụ na ebe ikuku si abata (Cross ventilation). Oge ụgụrụ ọ dị mkpa ka ikuku na abata ma na-apụ maka nchekwa ahuike Nke a ga-egbochi ọrịa dịka ụkwara nta ịwakpo ndi bi ebe ahu. Ọ dị mma ịṅụ mmrir oge ụgụrụ ma na aṅụ ya ọfụma. Ịnụ mmiri na-adị mkpa oge ụgụrụ Nkea bụ maka na ikuku ụgụrụ na amịkpọcha mmiri dị na-ahu mmadụ Ude nke na eme ka mmiri dị n'anụ ahu mmadu na adị mma (Moisturizer) Mmanụ a na-ete n'ahụ dị nma ichekwa ahụ oge ụgụrụ Ude mmanụ dị na ya na enyere kwa ezigbo aka n'ihi na mmanụ dịka nrị anu ahụ. Mkpụrụ osisi na akwụkwọ nrị na-enyere aka ọge ụgụrụ. Nri dịka kukumba na-adị mma n'oge ụgụrụ Ụmụ ihe dịka agwa, osikapa na adị kwa mma oge ụgụrụ Mkpụrụ akwụkwọ nrị dịka Kukumba na adị mma oge ụgụrụ. Etu ị ga-esi echekwa onwe gị n'ọkọchị Mkpụrụosisi ndị ị ga-eji tụọ ndụ gị mmanụ n'ọkọchị Akupe igwe na enyerekwa aka ibusasi nje oge ọkọchi. Igwe ntụoyi na-akpọnwụ kwa ahụ mgbe oge ụgụrụ. Ekwesiri ikpuchi ụmụaka ahụ oge ụgụrụ Ndị nwere ụmụaka ka-ekpuchi ha ahụ ọfụma maka oyi ma ọ bụ nje ndị a.
[ "Nri", "Oke Ihu Igwe", "Nrị na-edozi ahụ", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51045479
'Onwebeghị ihe ọbụla gọọmenti Ihedioha kwuru maka ebubo eboro Okorocha'
Ọnụ na-ekwuru Okorocha sị na Gọọmentị Emeka Ihedioha akpọghị Okorocha oku ka ọ bịa zara ọnụ ya tupu ha wepụta akwụkwọ ebubo nrụrụaka.
2020-01-09T13:27:05Z
Okorocha's Indictment: 'Onwebeghị ihe ọbụla gọọmenti Ihedioha kwuru maka ebubo eboro Okorocha' - Akwarandu
Rochas na Ihedioha Maazi Aic Akwarandu bụ onye enyemaka Ihedioha n'ihe banyere ọba mgbasaozi ọhụrụ ekwuola na gọọmentị ihedioha etinyebeghi ọnụ n'ebubo kọmiti nyocha boro Rochas Okorocha. Maazị Akwarandu sị na ọ bụ akwụkwọ nchoputa ka ya bụ kọmiti wetere. "Ọ bụ gọọmentị gụcha nchopụta ha o were kpebie ihe ọ ga-eme maka ya site na-iwepụta akwụkwọ Bekee kpọrọ "White Paper". Cheta na ngalaba nyocha gọvanọ Imo bụ Emeka Ihedioha hibere inyocha nrụrụaka ego n'ụlọ ọrụ akpọrọ "Imo State Oil Producing Area Development Commission" (ISOPADEC) boro Rochas Okorocha ebubo nrụrụka ijeri Naịra isii na ọma. Mana, ọnụ na-ekwuru Okorocha bụ Sam Onwuemedo si na ọ bụ enweghị ọru tinyere gọọmentị Imo n'ụzọ nnyocha a. Onwuemedo sị: "O nweghị ihe ọzọ ọ (Ihedioha) na-eme na-abụghị ịlụsa Sịnetọ Rochas Okorocha na ezinaụlọ ya ọgụ. Nke a bụ makana ọ maghị etu esi achi ọchịchị." Ihedioha na Okorocha a na-ama aka n'Imo? Abụ m APC, APC bụ m - Okorocha Akụkọ dị mkpa taa: Nwosu ga-bụrịrị gọvanọ - Okorocha "Ya mere chi bụọ Okorocha, chi ejie Okorocha. E hiwela Kọmịtị ruru iri abụọ na atọ. Ihe ndi Kọmịtị ndi a ma bu Okorocha, Okorocha, Okorocha." "Gọọmentị Imo edela mkpesa nye EFCC, dee nye ICPC, ma nọkwara n'ime ya na ehibe kọmịti." Maazi Akwarandu gwara BBC Igbo na ọ bụghị eziokwu na onyeisi ya na-achụgharị Okorocha. Ọ sị: "Ọ bụghị ebubo ka eboro Okorocha. Ọ bụ ihe dị na-akwụkwọ nchọpụta ngalaba nyocha. Ọ ka bụ akwụkwọ nchọpụta enyere Gọọmentị, o nwebeghị ihe gọọmentị kwuru maka ya." "Gọvanọ enweghi agha ọ na-ebuso Okorocha makana ihe agba n'aka adịghị enyo ya enyo. Kọmiti a so n'ime ndị nke Ihedioha hibere ka ọ banyere n'ọchịchị." "E nwere nke na-enyocha ọkpuru ọchịchi ime obodo, nwee ndị nke na-enyocha ngalaba dị iche iche. "Onye mecha nke ya, o wete ya. Onweghi onye Gọvano Ihedioha na-ata amụsụ." Ọ gakwara n'ihu kwuo na Gọvanọ Ihedioha na-agwa ndị nọ n'ọkwa ugbua na nnyocha na-egosi na ha rituo n'ọkwa, ndi ọzọ enyochakwa ha. Onwemedo na onwe ya gara n'ihu kwuo na ya bụru na Okorocha were ego, ha gosi ebe o bu ya gawa. Ọ sị: "Cheta oge ha bịara ọhụru ha sị na Okorocha buru ijeri Naịra iri ise ma maburu ụgbọala ruru 67 kemgbe ahụ o nwebeghi ihe ha kwuru maka ya." Ọ sị ka ajụọ gọọmentị Imo ebe etinyere ego ha sị na Okorocha buru na ISOPADEC. "Kpọọnụ aha ebe e buru ego gawa na ndị Naịjirịa nụ ma maa ikpe." BBC Igbo juburu Rochas Okorocha n'onwe ya ihe o chere maka nnyocha gọọmentị Ihedioha na-enyocha ya na mkparịtaụka e mere n'ọnwa Ọktọba nke 2019. Lee ihe o kwuru:
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Mpụ", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51045476
E nyela onyeisi NCAC bụ Olusegun Runsewe oche na nga
Ụlọikpe elu dị na Abuja etinyela Minista na-ahụ maka nka na ọmenala na nga.
2020-01-09T17:43:49Z
E nyela onyeisi NCAC bụ Olusegun Runsewe oche na nga
Onyeisi ngalaba na-ahu maka nka na ọmenala Okaikpe nke ụlọikpe ukwu na Abuja bụ Jude Okeke enyela iwu ka e tinye Olusegun Runsewe, onyeisi ngalaba na ahụ maka nka na omenala bụ National Council for Arts and Culture (NCAC) na Bekee na mkpọrọ. Nke a mere dịka ndị ụloọrụ Ummakalif Limited gbara ya akwụkwọ maka ịnupụ isi na iwu ụloikpe nyere na mbụ. Ihe butere ya bụ mmeche e mechiri "Art Village' n' Abuja. Ụlọọrụ Ummakalif kwuru na mmechi obodo ahu abụghị ihe dị na akwụkwo nkwekọrịta ọrụ ha na ngalaba ahụ nwere. Ọ bụ na ụbọchi nke iri abụọ na otu nke 2019 ka ndị ụlọọrụ Ummakalif gbara Runsewe akwụkwọ ma sị ka ụlo ikpe kpọchie ya maka ịnụpu isi na iwu ụloikpe nyere na ụbọchi iri na ise nke ọnwa Disemba 2017 ka a hapụ imetu ihe ọbụla aka na ya ogbe nka. Ulọọrụ Ummakalif gbakwara Minista Abuja, ngalaba 'Federal Capital Development Authority na Minista na-ahụ maka Omenala na njem nlegharị anya. Iwu ọhurụ apụtala maka mgbasaozi Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed enyela iwu ọhụrụ na ụlọ mgbasaozi niile dị na Naịjirịa ga-enweriri akụkọ si Naịjirịa na pasentị iri asaa. Iwu ọhụrụ ahụ machikwara ụlọọrụ mgbasaozi iji egwu ọbụla eme ihe n'akwụghị ndị nwe ya ụgwọ. Ashley Young agbajọọla Manchester United Ashley Young agbajọọla ndọtị Manchester United chọrọ ịdọtị ikike ọrụ ya n'aka ha dịka otu Intermilan na-achụsị ya ike. Young gbara afọ iri atọ na anọ bụ onye ndu otu Manchester United ga-esonye Inter Milan ma oge ya bịa na njedebe n'ọnwa ole na ole na-abịa. Azọpụtala ụmụaka iri abụọ nọ 'Orphanage' uweojii sị enweghi akwụkwọ na Kaduna na Kano Ndị uweojii na Naịjirịa azọpụtala ụmụaka iri abụọ na asaa na ebe eji ha n'ụzọ ezighiezi na steeti Kanu na Kaduna Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kano bụ Abdullahi Haruna gwara BBC na gọọmentị enyeghi ndị nwe ụlọ ndị enweghi nne na nna a ikike ịrụ ọru. Ụmụaka ndị a dị afọ atọ ruo iri na abụọ. Maazị Haruna sị: "Nwoke a nọ na arụ ọrụ a ọtụtụ afọ na-ejighi ikike gọọmentị. Nke a migidere iwu." "Anyị zọpụtala ụmụaka iri an itoolu na ụlọ nchekwa Du Merci dị na Kano na asato na ogige ha di na Kaduna nke wetere ya ụmụaka 27." NUC egburiela agụmakwụkwọ 'Mass Communication' Ngalaba na-ahụ maka mahadum bụ Nigerian Universities Commision egburiela atumatu ịgụ maka mgbasaozi Bekee kpọrọ Mass Communication ụzọ asaa. NUC si na nke a bụ ime ka atụmatụ ahụ kwụrụ chịm n'ụwa ọhụrụ a nọ na ya. N'ofesi, Obi Ezewannyị Briten agbarụọla ihu maka atụmatụ Nwaeze Harry na nwunye ya Meghan nwere. N'ozi ha wepụtara, ọnụ ndị na-ekwuruu Ezenwanyị Eliza sị na Harrry na Meghan agwaghị ha na ha chọrọ ịpụ n'ọgbọ N'egwuregwu merụru ahụ n'aka Ọgba bọọlụ Kelechi Iheanacho na-ewu na Twitter. Nke a nụ maka kpọcha kpọcha goolu o nyere iji nyere otu Leicester iji gbaa nhatanta n'asọmpị ha na Aston Villa ụnyaahụ Ngalaba aka na-achí imo steeti bụ Emeka Ihodeioha hibere iji nyocha ikuku kuru n'ụlọ ọrụ akpọrọ "Imo State Oil Producing Area Development Commission" (ISOPADEC) eboola Sineto Rochas Okorocha ebubo nrụrụaka. Romanus Ezeogu bụ onyeisi ngalaba ahụ sị aka Okorocha dị na ijiri naịra isi na ọma a na-achọ achọ. Nyocha ngalaba a bụ site ọnwa Mee 2011 ruo Mee 2019. Ihe ha tinyere anya bu nrụrụaka metụtara ijeri naira isii n'ọma. Ha sị na Okorocha wepuru ego ISOPADEC n'ụzọ n'ezighiezi. Ndị oyi egwu egbuola ọtụtu ndị agha na Borno Ndị agha ahụ si Damaturu na-aga Maiduguri mgbe ha zutere ọnwụ ha Mbada ọgụ dara n'etiti ndị agha Naịjirịa na ndị oyi egwu n'obodo Monguno dị na Borno steeti ataala isi ndị agha ruru iri abuo na ndị nkiti atọ. Dịka ụlọntaakukọ Reuters and AFP jiri kwuo anya hụru ya bụ ọgụ sị na ndị omekome a ji ụgbọala ndị agha nwete ohere ịbanye n'ime Monguno ma malite ịkwa mgbọ. N'ofesi, Nwa eze Harrry na Nwunye ya bụ Meghan ekwuola na ha aghaịzị esonyesịa n'emume ndị be Ezenwaanyị Briten na-eme. Harry na Meghan sị na ha ga-agba mbọ etu ha ga-eji kpatawa akụnaụba nke ha. N'Egwuregwu, Wilfred Ndidi bidoro ịgbara Super Eagles n'afọ 2015 Ọgba bọọlụ Wilfred Ndidi nwereike wụsa ọwa nwamgbenta iji nweta ohere iji nyaa mmerụ ahụ onwetere dịka Leicester na akwado asọmpị A na-ele anya na ọ ga alaghachite n'ọnwa Febụwarị. Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Mpụ", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51053613
Ego ole ka Harry na Megan na-agbakụta azụ ugbua ha chọrọ ịchọwa akara aka ha?
Ebe ka ego Harry na Meghan na-eri dịka ndị be eze si?
2020-01-09T19:45:11Z
Ego ole ka Harry na Megan na-agbakụta azụ ugbua ha chọrọ ịchọwa akara aka ha?
Harry na Meghan lụrụ onwe ha n'afọ 2018 Harry na Meghan lụrụ onwe ha n'afọ 2018 Obi adịghị ezinaụlọ Ezenwaanyị mba Briten bụ Elizabeth mma na nwanwa ya bụ Harry na nwunye ya bụ Meghan kwupụtara na ha ga anọrọ onwe ha, chụwa ego nke ha. Ụbọchị Wenezde, Harry na Meghan kwuru na ha achọghịzịkwa ịbụ ndị welitere isi n'ezinaụlọ eze, na ha chọrọ ịgawa Kanada nakwa Amerịka ịchụ akara aka ha. Lee ihe mere n'agbamakwụkwọ Harry na Meghan Markle Ihe ndị mmadụ kwuru maka agbamakwụkwọ Harry and Meghan Nke a na-abịa ọnwa ole na ole ha tụchara arịrị maka agwa ọjọọ ndị ụlọọrụ akụkọ na-akpaso nwunye bụ Megan. Okwa ha mara maka ịchụwa ego nke ha butere okwu ebe ka ego ha na-eribu si? Ego ole ka ha na-enwetabu? Di na nwunye a gbara ama na pasent 95 ego nnweta ha si n'aka Ọkparaeze Charles, nna Harry. Meghan na Harry bụ nnu na mmanụ Ọ na-akwụ ha ụgwọ ọrụ ọha ha na-arụ dịka 'Duke' na 'Duchess' nke Sussex nakwa ego igbo mkpa ezinaụlọ ha. Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a : Harry na Lọọlọ Meghan ekelela ụwa Ọ bụ nwa nwoke! Harry na Meghan eritela ike karịrị nde paụnds ise(#5m) nke pụtara ijeri naira abụọ na ụma(N2,355,000,000) bido n'afọ 2018 a lụtara Meghan were rue 2019. Ego bụ ego si n'ụlọ na ihe na-amịta ego nke Charles si na ya nweta ihe ruru £21.6m. Ha na-enwetakwa pasent ise ego site na 'Sovereign Grant' bụ ego obi eze na-eketa. Harry na Meghan eketakwara ego ruru £13m bụ ego nne Harry bụ Diana hapụrụ. Diana dịka ya na ụmụ ya Harry na William zụkọtara o ge ha gara Toronto n'afọ 1991 Harry ketakwara ego na ekpe nnenne bụ nne mụrụ Ezenwaanyị Elizabeth hapụrụ. N'onwe ya, Meghan na-erite ego ruru £38,300 site n'ihe nkiri o sonyere na ya, ejiji nakwa ide ihe na intanet. Iwu ji ezinaụlọ Ezenwaanyị Briten enyeghị onye ọbụla bụ onye ezinaụlọ ahụ ohere ịrụ ọrụ ọzọ iji kpata ego. Ọkwa ndị ezinaụlọ Ezenwaanyị Elizabeth na etu ha si nọrọ nso n'oche Eze Briten Ugbua ha chọrọ ịchụwa nke ha, a na-eche na ha ga-ebido nwetawa ego site na ide akwụkwọ. Ha gbaburu ama na ha chọrọ ibido ụlọrụ na-enyere ndị mmadụ aka. Ha nwekwara ihe ndị ha tinyere aha 'Royal Sussex' ha na-ere dịka mkpọ eji etinye mkpịsị odee, ihe egwuregwu nakwa ọzụzụ banyere agụmakwụkwọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ụmụafọ Igbo iri bụ 'entrepreneur' kajara akaja Slay Queen: Gịnị ka ọ pụtara? Ihe ndị a ga-adị ndị a mụrụ bido n’afọ 2000 ka ‘film’
[ "United Kingdom", "Akụ na ụba" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51060271
Buhari akatọọla ndị oji egbe gburu mmadụ 12 na steeti Platu
Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla mwakpo ndi oji egbe wakporo obodo Kulben dị na Plateau.
2020-01-10T08:37:37Z
Buhari akatọọla ndị oji egbe gburu mmadụ 12 na steeti Platu
Mwakpo e mere n'ime obodo Kulben dị na Platu steeti ataala isi mmadụ iri na abụọ ma merụọ otu ọzọ ezigbote ahụ. Ndị uweojii sị ọ bụ n'ehihe Wenesde ka ndi oji egbe wabatara na ya bụ obodo ma malite kwawa mgbọ. Onyeisila Muhammadu Buhari katọrọ mwakpo ma sị na a ga-achọpụ ndi kpara mkpa mkpa a. NLC sị ndị Gọvanọ akwụbeghị ọgwọ ọnwa opekatempe sonye ọsịsọ Ndị ọrụ NLC Otu ndị ọrụ akpọrọ Nigerian Labour Congress enyela aka na-achị steeti dị iche iche na Naịjirịa ruo ngụcha ọnwa Janụwarị 2020 ịsonye qụọ ọgwọ ọnwa opekatampe ha na gọọmentị kwekọrịtala n'afọ 2019. Ha sị na ọ bụ sọsọ steeti isii malitere ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe a. N'Ofesi, Meghan na Harry Meghan bụ onye nwere ọbara isi ojii mbụ a na-alụbata n'ụlọ eze ndị Briten n'ime ihe ruru afọ 100 Nwunye nwa eze Harry bụ Meghan ahapụla mba Briten gawa Canada dịka ya na di ya kwuru na ha na-awụsa ọwa n'iso n'ihe ndị be Ezenwanyị Eliza na-eme. Ezenwaanyị Eliza na onwe ya ekwuola site n'ọnụ ndi na-ekwuru ya na a na-achọ usoro nhazi ọnọdụ mmadụ abụọ a. N'Egwuregwu, Ndi Rangers na-enwe anụrị mgbe a nyere goolu Rangers buru iko NPFL n'afọ 2016 Ọ ga-akpọtụ akpọtụ n'Enugwu ụbọchị Sonde oge Rangers na otu egwuregwu Nouadhibou nke Mureshus ga-ezute onwe ha na ama egwuregwu Nnamdi Azikiwe Asọmpị a bụ nzute nke abụọ otu abụọ n'iko CAF nke ọkpọ a . Ndị ntọrị atọrọla Seminarian anọ na Kaduna Ndị ụkọchukwu Katolik Ndi uweojii na Kaduna si ndị ntọrị yi uwe ndi agha tọọrọ ụmụakwụkwọ anọ n'ụlọakwụkwọ akpọrọ Good Shepard Major Seminary dị n'ụzọ Abuja. Ndị uweojii sị na ha na-achụ ndị kpara ike n'ike iji zọpụtata ụmụakwụkwọ a. Ndị omekome egbuola ndị agha Niger Ndị agha Niger egburu na ọnwa December 2019 Ndị omekome a na-eche na ha na Alqeada nwere mmekọ egbuola ndị agha iri abụọ na ise na oke ala mba Niger na Mali. Isi mmadụ iri isi na ato n'ime ndị bịara ọgụ a nakwara mụọ na ya bụ mkpa mkpa kpara ụnyaahụ N'Ofesi, Mba Amerịka na Canada na-ebo mba Iran ebubo na ọ bụ ha ji ogbunigwe elu gbatuo ụgbọelu mba Ukraine si ọdọ ụgbọelu ha fepu. Ha sị na ọ bụ na-amaghi ama ka Iran jiri mee ihe mana Iran na-ago si na ha ka na-eme nyocha ihe kpatara ya bụ ụgbọelu jiri daa N'Egwuregwu, Real Madrid and Atletico Madrid ga-ezute onwe ha na mgbacha iko akpọrọ Spanish Super Cup ga-esu ụbọchị Sunday. Atletico jị ọkpọ gọọlụ atọ asatara abụọ merie Barcelona ụnyaahụ ji tozuo
[ "Kaduna", "Kaduna steeti", "Niger" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51067550
Ihe ị kwesịrị ịma maka Chukwuemeka Ike, onye dere 'Bottled Leopard'
Odeakwụkwọ a ma ama bụ Eze Chukwuemeka Ike anwụọla n'ụlọọgwụ dịka ọ gbara afọ 88.
2020-01-10T19:57:01Z
Bottled Leopard: Chukwuemeka Ike, onye na-ede akwụkwọ a ma ama, anwụọla
Chukwuemeka Ike Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na Chukwuemeka Ike anwụọla. Ọ nwụrụ dịka ọ gbara afọ iri asatọ na asatọ n'ụlọọgwụ Nnamdi Azikiwe nke dị na Nnewi. APC akwala arịrị n'ọnwụ Sịnetọ Uwajumogu Ebubatala ozu Ekwueme Otu onye ma maka ọnwụ Igwe Ike sị na "ọ nwụrụ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwarị dịka ọ rịara ọrịa obele oge." Ọ sị na dịka ọ bụ Eze, akpọbeghị okwu ọnwụ ya aha kpọm kwem. Chukwuemeka Ike bụ Igwe na-achị Ndikelionwu dị n'okpuruọchịchị Orumba North n'Anambara steeti. Akwụkwọ e ji mara ya bụ Bottled Leopard nakwa ndị ọzọ. Ihe ise ị maghị maka Chukwuemeka Ike - Ọ mụtara nanị otu nwa aha ya bụ Osita Ike mana ọ nwụọla. - Ọ lụrụ onye Yoruba bụ Ọkammụta Adebimpe Ike. - Ọ bụ Eze Ndikelionwu dị n'Anambra steeti dịka nna mụrụ ya siri bụ - Ọ bụ ya mere ka a na-akpọ ị ghọ aghụghgọ n'ule "Expo" site n'akwụkwọ o dere maka ya a kpọrọ "Expo 77" Ndị mmadụ na-akwanyere ya ugwu ikpeazụ Onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'okpuru PDP bụ Atiku Abubakar si ka mkpụrụ obi ya laa na ndokwa Uzochukwu Nkamuke kwuru etu na ọnwụ Igwe Ike wutere ya Michael Chiedoziem kwuru na ọ bụ odogwu n'odeeakwụkwọ Chioma kwuru na akwụkwọ ya Bottled Leopard bụ akwụkwọ kachasị masị ya Akụkọ ga-amasị gị Ụmụakwụkwọ chọrọ ide JAMB awakpoola ụlọọrụ NIMC n'Enugwu,Legọs Ugboro asatọ a gbaturu ụgbọelu
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51102881
Etu azụ okporoko si bata Naịjirịa n'ihi agha Bịafra
Okporoko bụzị nnọọ nnukwu ihe oriri n'ala Igbo nakwa Naịjirịa gbaa gburugburu mana ọ bụ Agha Biafra mepere ụmụ Naijiria anya n'ebe ihe ụtọ a dị.
2020-01-14T12:18:31Z
Biafra at 50: Etu azụ okporoko si bata Naịjirịa n'ihi agha Bịafra
Ọgbọ Okporoko Ahịa okporoko abụghịkwa ahịa ndị ogbenye na-azụ maka na e ji nnukwu ego azụ ya. Agha Biafra wetara nnukwu ihe mgbu, agụụ na ọnwụ nye ọtụtụ ndị Igbo. Mana ọ bụghịkwa naanị ihe ọghọm ka ya bụ agha wetara. Otu ihe bara uru mmadụ nwere ike ikwu n'ọgụ Biafra wetara bụ azụ okporoko. Joseph Achuzia, Dike Biafra alaala Okporoko bụ nnukwu ihe oriri n'ala Igbo nakwa na Naịjirịa niile. N'ezie, okporoko abụghị ụdịrị azụ ị ga-ahụ n'ite ofe nwa ogbenye. Kedụ ka okporoko si bata ala anyị: Mba Norway bụ ndị e ji azụ okporoko mara Mba Norway bụ mba e ji ịkụpụta azụ okporoko wee mara. Tupu obodo ahụ achọpụta mmanụ agbidi nakwa ikuku gaasị na be ha, okporoko bụ ihe ha jiri biri. Taa, okporoko bụ ihe nke abụọ kacha enye Norway ego. Naịjirịa bụkwa mba kacha atụbata okporoko n'ụwa niile. Isi okporoko Frank Jensen, onye ọkachamara maka akụkọ ihe mere mgbe gboo (History) gwara BBC na ọ bụ n'oge agha Biafra ka okporoko batara Naịjirịa. Mgbe a na-alụ agha na Naịjirịa, oke aguu na ọrịa gburu ọtụtụ ụmụaka na ndị okenye Biafra. Otu dị icheiche nakwa ụlọụka di icheiche malitere izite nri na ihe ndị ọzọ iji nyere ndị Igbo aka. Ebe a na-ere okporoko n'ahịa Oyingbo dị na Legọs Jensen kwuru na "ọ bụ azụ okporoko ka Norway zitere." "Ọ naghị emebi ngwa ngwa. O juputakwara n'ihe na-edozi ahụ." N'otu aka ahụ, Edwin Mofefe gwara BBC na ọ bụ okporoko zọrọ ha ndụ oge ọrịa kwashịọkọ na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ. Mofefe dị naanị afọ ise oge agha Biafra malitere. O kwuru sị: "Naanị azụ okporoko bụ ihe anyị nwere iji buso agụụ agha." "Ọ bụ ya ka anyị ji mere ọgwụ." Oge agha bere, Mofefe kwuru na ya ekweghị eri okporoko ọzọ n'ihi na o na-echetara ya ahụhụ ha gabigara oge agha. Mana ugbua, okporoko abụrụla ngwa nri e ji mara ndị Igbo. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ikpe ntuliaka Imo steeti amalitela na 'Supreme Court' Ihe ndị dị mkpa maka 'Finance Bill' Buhari binyere aka na ya Ọkụ gbara na Nnewi erughi ahịa mgbụka - Ndị na-agbanyu ọkụ Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Nri", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51065330
Ihe ndị mere Igbo ejighị Odumegwu Ojukwu, enyi Biafra egwu egwu
Ndị ma ya kwuru na Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ onye tụnyere ọkwa ya, oge ya nakwa ego nna ya maka ọdịmma Igbo bido n' oge agha Biafra rue n'ọnwụ ya.
2020-01-15T14:06:16Z
Biafra at 50 : Ihe mere Igbo ejighị Odumegwu Ojukwu egwu egwu
Colonel Emeka Ojukwu O meela afọ itoolu Ọchịagha Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, sorola ndị nnanna laa n'ọnwa Novemba afọ 2011(1933-2011), mana ude ya ka na-ede na mba niile. Ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ụmụ Igbo ka kpụ dike a duru Ọwụwa Anyanwụ Naijiria n'Agha Biafra n'onụ ọbụladị ugbua okwu nnwereonwe Biafra nwuuru ọkụ ọzọ. Nna Odumegwu Ojukwu kpara akụ eriwe agwụ agwụ Odumegwu Ojukwu gaara ịgba afọ 86 taa Biafra 50 years after: O meela afọ 50 a lụrụ agha Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme Nke a bụ n'ihi na bido oge ọ bụụrụ onye ndu Biafra rue ugbua, ha ahụbeghị onye ndu ọdịmma Ndigbo churu ụra ka ya. Ọtụtụ ndị okenye Igbo dịka Elliot Uko na-ekwu na ụdị akụ agwụ agwụ nna Ojukwu kpara zuuru ya ịgba ndị Igbo nkiti, nọọrọ onwe ya oge nsogbu butere Agha Biafra dakwasara ha. Mana o tinyere isi ya buru ya. Gee ihe Elliot Uko kwuru mere Igbo ji hụ Ojukwu n'anya karịa: Agha Biafra furu Ojukwu ihe nile o nwere; oge ya, ọgụgụisi nakwa ego nna ya. Emeka bụ nwa a mụrụ n'obi ọgaranya n'abalị anọ nke ọnwa Novemba afọ 1933 n'Ugwu Awusa n'ebe a kpọrọ Zungeru dị na Niger steeti. Nna ya, Louis Odumegwu Ojukwu, onye Umudim, Nnewi, Anambara steeti bụ nnukwu ọgaranya ka ibe ya n'Afrịka. Ọgbaaghara na-ada n'ụlọ Ojukwu Debe Odumegwu Ojukwu: Ihe ị kwesịrị ịma banyere ya Etu azụ okporoko si bata Naịjirịa n'ihi agha Bịafra O nwere ụlọọrụ njem ụgbọala ma bụrụkwa onyeisi mbụ nke 'Nigeria Stock Market.' Louis agụghị oke akwụkwọ mana o zigara nwa ya bụ Emeka ụlọakwụkwọ ọkaibe na Naijiria nakwa mba ofesi. Emeka gụrụ akwụkwọ na 'King's College' na Legọs nakwa na , Lincoln College na mahadum Oxford na mba Briten. Ojukwu si azụ ụlọ banye ọrụ amị n'afọ 1957 n'ihi na nna ya akwadoghị ya. Oge ahụ, ọtụtụ na-ahụta ọrụ amị dịka ọrụ ndị enweghị nke ha dị mma ya. Ndiagha zigara ya ọzụzụ na England nakwa Ghana, ma bulie ya n'okwa ka ọ lọghachiri na Naijiria n'afọ 1958. A tụgara ya Kaduna, e mecha mee ya onyeisi ndị agha na Kano. Ọ bụ ka ọ nọ n'Ugwu Awusa arụ ọrụ soja ka Kaduna Nzeogwu, Emmanuel Ifejuna na Adewale Ademoyega na ndị ọzọ kpara nkata ịkwatu gọọmentị n'ike n'abalị iri na ise ọnwa January afọ 1966. Ojukwu so na ndị mere na mbọ Nzeọgwụ na ndị otu ya gbara nyụrụ ọkụ pịị n'Ugwu Awụsa n'ihi okwukwe o nweburu na ịdịkọnotu Naịjirịa. Agụiyi Ironsi dịka onye kachasị nwe ọkwa na ndịagha Naijiria weere ọkwa onyeisiala mana ka onwa isii gachara, Murtala Muhammed chuturu ọchịchị ya n'ike. E gburu ọtụtụ ndị Agha Igbo welitere isi ma site na ya banye n'ọgbụgbụ ndị Igbo nkịtị n'Ugwu Naijria nke mere ka ọtụtụ ụmụ Igbo gbaa ọsọ ndụ gbalata ala Igbo. Ọ bụ dịka ogbugbu nakwa mgbagbu ndị Igbo riri elu karịa na-enweghị mbọ gọọmenti gbara ibelata ya ka Ojukwu dịka gọvanọ na-achị "Eastern Nigeria" kwuru ka ndị mpaghara ọbụla chịwa onwe ha. Nke a mere ka e nwee ọgbakọ ebe ndị isi Afrịka zukọrọ wee tinye ya bu okwu ọnụ. Odumegwu Ojukwu na-agwa ndị omeiwu Biafra okwu Julaị 16 1967 Ọgbakọ bụ n'obodo Aburi nke dị na Gana ka a nọ nwee ya, wee wepụta nkwekọrịta a kpọrọ 'Aburi Accord' nke onye ọbụla n'ọgbakọ ahụ binyere aka na ya. Mana ka ọgbakọ ahụ gachara, Yakubu Gowọn dịka Onyeisiala Naịjirịa n'oge ahụ, jụwapụrụ isi na ihe o kwetara n'Aburi' ma bido agha megịde ndị mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ. Ọ bụ n'abalị isii nke ọnwa Julai afọ 1967 ka Naịjirịa gbapụrụ ọnụ egbe mbụ bidoro agha Biafra n'obodo Gakem dị na Krọs Rivas steeti sokwa n' "Eastern Region.' oge ahụ. N'ọnụ Ojukwu, ihe o jiri gaa agha bụ " Iji gbaa mbọ hụ na a napụtara ndị Biafra n'atụmatụ ndị chọrọ ịkpochapụ ha." Yakubu Gowon bụ onyeisiala NAijiria oge a lụrụ Agha Biafra Agha Biafra nakwa agụụ so ya tara isi ụmụ Igbo karịrị nde atọ. Mana ihe kachasị tụọ mbaụwa n'anya bụ na ndị Igbo site na ntuziaka Ojukwu gbara aka ngwaọgụ lụọ agha ahụ dịka dịmkpa rụọ afọ abụọ na ụma! Kama ịda mba, ha jiri nka na agịrị isi rụpụta ọtụtụ ihe nyeere ha aka dịka ọgbunigwe, igwe na-esi mmanụ agbidị nakwa ihe ịtụnanya ndị ọzọ. Ka agha na-achọ ibi, Ojukwu nyefere Philip Effiong ọkwa onyeisi Agha Biafra ma gbaa ọsọ ndụ gaa Ivory Coast. Ezinaụlọ ya: Alum di na nwunye Emeka Ojukwu na Bianca gbara akaebe na ihunanya amaghị okenye maọbụ agadi Ojukwu bụ mmadụ ọha ma bụrụkwa onye ejighị obibi ezinaụlọ egwu egwu. Ọ lụrụ Bianca Onoh, nwa Christian Onoh, onye bubu Gọvanọ Anambara steeti ochie, ha mụrụ ụmụ atọ. Bianca, bụbụ onye nwetara nzere Agboghọ kachasị mma mma na Naijiria tupu ọ lụọ Ojukwu Mana tupu ọ lụọ Bianca, Ojukwu luburu Njideka, onye ya na ya zutere oge ọ na-agụ akwụkwọ n'ala Bekee. Ụmụ ndị ọzọ Ojukwu mụrụ gụnyere Debe(ọ lala mụọ) na Emeka Ojukwu nke obere, Ebere na Okigbo. Ụwa mgbede ya Ojukwu mechara lọghachi Naijiria oge ọchịchị Shehu Shagari ma soro zọọ ọkwa ọchịchị n'otu NPN n'afọ 1983. A tụnyere ya na ndị nọ n'ọchịchị oge ahụ na mkpọrọ oge Muhammadu Buhari weghara ọchịchị dịka onye agha. E mecha tọghapụ ya n'ihi na ha atụtaghị ya aja n'ahụ. N'ọnwụ, gọọmenti Goodluck Jonathan nyere Ojukwu nkwanye ukwu pụrụ iche dịka onyeisi agha Ọ bụ ihunanya mere Igbo ji nye Ojukwu echichi 'Ikemba' nakwa 'Dikedịọra mma.' Ka ọ nwụrụ n'ọnwa Novermba afọ 2011, o mere ọtụtụ ndị Igbo anyammiri dịka ha na-atụ arịrị na "enyi Biafra alaala." Iji tie ndị mmadụ aka n'obi, Gọọmenti Naijiria n'oge Goodluck Jonathan kwanyeere Ojukwu ugwu zuru oke dịka onyeisi agha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mwepụ Emeka Ihedioha Etu azụ okporoko si bata Naịjirịa n'ihi agha Bịafra Amụma Mbaka emezuela, Hope Uzodinma emeriela dịka Gọvanọ Imo steeti
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51112184
'Ọkwa onyeisiala kwesiri ndị Igbo, anyị agaghị arịọ ya n'arịrịọ' - Nduka Eya
Ichie Nduka Eya bu otu n'ime ndị lụrụ Biagra agha gwara BBC Igbo na okwu inye onye Igbo ọchịchị agbụghị ihe ekwesiri ịrọ arịrịọ.
2020-01-16T07:11:01Z
Biafra at 50: 'Ọkwa onyeisiala kwesiri ndị Igbo, anyị agaghị arịọ ya n'arịrịọ'
Ichie Nduka Eyah Ichie Nduka Eya kwuru nke a na mkparịtaụka nke BBC Igbo kpokọbara maka ncheta afọ 50 kemgbe agha Biafra biri. O kwuru na ọ bụghị tigbo zogbuo ka a ga-eji nweta ihe ndị Igbo na-achọ. Naijirịa ga-anọ n'ọchịchịrị maọbụrụ na onye Igbo achịghị - Ohaneze A na-akpachapụ ndị Igbo na Naịjirịa - Chukwuemeka Ezeife Onyeisiala Igbo ga-abụ ọpụrụiche - Nwobodo Cheta na Ichie Nduka bụ otu n'ime ụfodụ ndị lụrụ agha Biafra mgbe ọ dara n'afo 1967. Ọ kọwakwara na Igbo dị Naịjirịa mkpa nke mere na agaghị a gbahapụ ha n'ihe gbasara ọchịchị. N'ọnụ ya "Igbo so na ụkwụ atọ Naịjirịa kwụ n'elu ya. Ewepu otu ụkwụ kedụ etu Naịjirịa ga-esi kwụrụ?" Onye ọzọ so kwa na mkparịtaụka a bụ Chinedu Mbah onye kpokọbara otu Ndị Igbo United. Ọ sị na oge eruola mgbe ụmụ Igbo ga abịakọta ọnụ jiri otu olu kwuo ihe ha chọrọ ma sowe ya. O kwuru na ndị Igbo sepụ aka n'ihe niile ga-ebute agha ọzọ. Ihe ndị pụtara na mkparịtaụka a n'aha ịchafụ 1. Anyị chọrọ onyeisiala Igbo dị mma na abụghị onyeisiala Igbo nkịtị" 2.  Ndị ahụghị ndị Igbo n'anya kpọrọ 'coup' mbụ 'Igbo coup' 3.  Mmegbu ndị Igbo abụghị taa ka o bidoro 4.  Iwu Hate speech bụ kaiji mechie Igbo ọnụ 5.  Ndị e nyere 20 paunds ejirila ya merie ndị nyere ha 20 paunds. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị Ihedioha apụọla na Douglas House' dịka e duru Uzodinma iyiọrụ Amotekun: Gọọmenti etiti esepụla ndị ndịda-anyanwụ ara n'ọnụ
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51116914
Uzodinma: Tanko rituo dịka Ọkaikpe Naịjirịa - PDP
Otu PDP akoola oku ka e kpegharịa ikpe nyere Hope Uzodinma oche Gọvanọ Imo steeti ma kpọọ oku
2020-01-16T07:34:49Z
Uzodinma: Mkpebi Ụlọikpe Kachasị enweghị ebe ọ gbadoro ụkwụ - PDP
Uzodinma: Tanko rituo dịka ọkaikpe Naijiria - PDP Tanko Mohammed Otu pati PDP akpọọla oku ka ỌkaikpeTanko Mohammed rịtuo n'ọkwa dịka ọkaikpe Ukwu Naijiria nakwa onyeisioche otu na-ahazi ikpe bụ 'National Judicial Council'. PDP kpọrọ oku a ka ha nwechara ọgbakọ imeobi n'ụbọchị Tọzde n'ihi mkpebi Ụlọikpe kachasị nke napụrụ Emeka Ihedioha nke PDP ọkwa Gọvanọ Imo steeti ma nyefee Hope Uzodịnma nke APC. N'ozi nke Onyeisioche pati ahụ bụ Uche Secondus ziri ndị ntaakụkọ, o sịrị na "Ụlọikpe kachasị nke Tanko bụ onyeisis ya enwezighị ntụkwasịobi, kama ha na-emezi mbunuche gọọmenti APC." Ha gara n'ihu sị na, "Mkpebi Ụlọikpe kachasị nke kposara mmerị Emeka Ihedioha (onye nwetara vootu 276,404) ma jiri vootu amaghị ebe o si kpọpụta Hope Uzodimma nke APC, onye nwetara vootu dị 96, 458 dịka gọvanọ Imo steeti bụ ihe jọgburu udele sigbuo nkapị, ma bụrụkwa ụzọ nwere ike ibute nsogbu. O kwesịrị ka e kpegharịa ya." Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Kingsley Obiora, nwa afọ Igbo Buhari họpụtara dịka osote onyeisi CBN Kingsley Obiora na Godwin Emefiele Onyeisiala Muhammad Buhari ahọpụtala Kingsley Obiora maka ọkwa osote onyeisi ụlọakụ etiiti bụ CBN. Ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina onye gbara ama a kwuru n'ozi o zigara ụlọọrụ ntaakụkọ na "Onyeisiala Buhari wegara aha Kingsley Isitua Obiora ụlọomeiwu Ukwu maka nkwado maka ọkwa osote onyeisi ụlọakụ etiti." A na-atụ anya na Obiora, onye welitere isi n'ụlọakụ mba ụwa bụ IMF ga-anọchi Joseph Nnanna, onye ga-ala ezumike nka n'abalị abụọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020. Obiora, onye a na-agba ama na ụbụrụ ya na-achọ ọkụ dịka o jiri 'First Class pụta na mahadum gụrụ 'Economics na mahadum 'University of Benin' nakwa Mahadum 'University of Ibadan.' Nwoke gbara afọ iri nanọ na-atọ na- arụ n'ụlọakụ mba. Aka m adịghị na mwepu Ihedioha - Osinbajo Osote onyeisiala Yemi Osinbajo agọrọla aka ya na ụkwụ ya n'asịrị na-efegharị nke na-ekwu na aka ya dị na mwepu ụlọikpe Supreme Court wepuru Emeka Ihedioha dịka gọvanọ Imo Steeti. Laolu Akande ọnụ na-ekwuru Osinbajo, kọwara na akụkọ ahụ bụ fa fa fa - Fawul... maka na otu mkpụrụ eziokwu adịghị na ya. Rochas Okorocha sị na ya adịghị atụ ụjọ nnyocha Hope Uzodinma Onye chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ya adịghị akụja maka atụmatu nyocha ọbaego Imo steeti aka na-achi Imo bụ Hope Uzodinma kwuputara ụnyaahụ. Gọvanọ Uzodinma kwuru maka nyocha ọbaego a ka ọ na-anabata iyi ọrụ e duru ya na-steeti ahụ, ebe ọ nọ kwuo na ọ na-enye onye nchịkọta akụnaụba steeti ahụ iwu ka o zitere ya ihe gbasara ọnọdụ mkpata na mmefu ego steeti ahụ site n'afọ 2010 ruo ugbua, n'ime ụbọchị anọ. Hope Uzodinma aṅụọla iyi ọrụ Ihe ndị mere Igbo ejighị Odumegwu Ojukwu, enyi Biafra egwu egwu Amụma Mbaka emezuela, Hope Uzodinma emeriela dịka Gọvanọ Imo steeti Sinetọ Okorocha dere n'akara Twitter ya na ihe ya ekweghị na ya bụ iji atụmatu nyocha na-amaja ya, ezinaụlọ ya nakwa ndị na-akwado ya. O kwukwara ka ndị odeakwụkwọ mịnịstrị niile nọ na steeti ahụ zitere ya ebe kọntratị niile e kerela na steeti ahụ kwụ akwụ ugbua, ma gbagodu 'brake' n'ọrụ ọbụla a na-arụ. Anyị achọghị 'Eco' Ndị mba ECOWAS na-asụ bekee ajụla atụmatụ ịhọrọ otu akwụkwọ ego a kpọrọ 'Eco' maka nzụkọrịta ahịa na mpaghara ahụ. Ndị DSS akpaala ike Ndị DSS Ndị ọrụ nchekwa DSS azọpụtala ndị ọrụ enyemaka mmadụ ise bụ ndị otu a kpọrọ Islamic State of West African Province ISWAP tọrọ kamgbe afọ gara aga. Mmadụ ise ndị azọpụtara gụnyere Jennifer Samuel Ukumbong, Adabe Cletus, Adamu Auwal, Arthur Ibojekwe China na George Danbaba Michael. Anyi kwadoro Amotekun - Nnamdi Kanu Abaribe, El-shalom na Tochukwu Uchendụ gbaara Nnamdi Kanu akaebe mgbe eji ya eji Nnamdi Kanu bụ onye ndu Ipob ekwuola na ndi otu ya ga-enye atụmatụ Amotekun nkwado pụrụiche. Na mkparịta ụka omere n'akara Facebook Radio Biafra ụnyaahụ, Kanu sị na Amotekun dịka ngalaba Biafra Secret Service otu Ipob wepụtara bụ nke ọ sị ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ kwaturu. Ọgbaghara Kenya Otu onye anwụọla ebe ọtụtụ ndị merụrụ mgbe ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị na-eme ngagharịiwe na ndị uweojii na mpaghara Kasarani dị na Kenya. Ndị a malitere ime ngagharịiwe kamgbe abalị anọ n'ihi ọnọdụ ọjọọ nke okporoụzọ dị n'ebe ahụ. Marcus Rashford na-agbara Machester United bọọlụ nwereike ọ gaghị eso gbaa asọmpị ha ndị Liverpool n'ụbọchị Sọnde n'ihi mmeru ahụ. Onye nchịkọta ha bụ Ole Gunnar Solskjaer sị na ọ bụ mkpebi ya itinye Rashford n'asọmpi ha ụnyaahụ kpatara nke a. Ọkụ gbara ụlọobibi ụmụakwụkwọ na Mahadum Michael Okpara Ọkụ gbara IBB Hostel dị na Michael Okpara University Of Agriculture dị n' Umudike Abia Steeti ụbọchị Wenezde. O nweghị onye nwụrụ na ya bụ ọkụ gbara mana ndị nọ ebe ihe mere kwuru n'ọkụ ahụ gbara akwa na ụfọdụ ihe ha jiri biri. Ụfọdụ rụtụrụ aka na ọ bụ nsogbu si na ngwa ọkụ latrik nwere ike ibute ọkụ ọgbụgba ahụ. Otu nwata akwụkwọ ụklọakwụkwọ ahụ bụ Chukwuemeka Ndubisi kwuru na ọ bụ Ụmụakwụkwọ n'dị nche mahadum ahụ gbakọtara aka menyụọ ya bụ ọkụ. Nke abụghị mbụ ọkụ na-agba na ya bụ mahadum, ọkụ gbara gbara n' ụlọbibi ndị PG mahadum ahụ n'afọ 2015. Mba isii ajụla nkwekọrịta Ecowas inwe otu ego Naijiria na mba ise ndị ọzọ so na mba isii na-asụ bekee nọ n'otu Ecowas akatọla nkwekọrịta ndị mba asatọ ndị ọzọ ndị na-asụ Frnshị maka iji otu ego azụ ahịa n'Ecowas. Ihe Trump mere doro ya anya - Parnas Foto a gosiri Lev Parnas bụ onye ojiego achụ ego si mba Ukren na Amerịka bụ enyi ọkaiwu Onyeisiala Trump Lev Parnas bụ otu onye na-arụrụ Rudy Giuliani bụ ọkaiwu Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, ekwuola na ihe ọ mere so n'ihe e ji enyocha ya n'ụlọomeiwu ukwu ugbua, doro ya anya nke ọma. Parnas kwuru na ihe Trump na Giuliani nọ na-eme gbasara ndị mba Ukren inyocha Joe Biden bụbụ osote onyeisiala mba Amerịka, na nwa ya nwoke abụghị inyocha mpụ, na ọ bụ imetọ aha onye ya na Trump na-azọ ọkwa. Nke a na-eme ka ndi omeiwu nta n'Amerịka họpụtara mmadụ iri na abụọ ga-agara ha ikpe ichutu Trump N'ọrụ n'ụlọ omeiwu ukwu. Joshua na Pulev Anthony Joshua na Joseph Parker Oti ọkpọ mba Bulgaria bụ Kubrat Pulev na-ekwu na ekpebiela ọgụ ya na Anthony Joshua ka ọ bụrụ n'ọnwa May afọ a. Pulev na-ama Joshua aka iji mara onye bụ ọkaibe na ogoogo IBF, mana Joshua ekwubeghi ihe ọbụla maka ọgụ a. N'egwuregwu, Otu mkpụrụ goolu Juan Mata nyere n'old Trafford, nyere Manchester United mmeri ha ji wee wụbanye n'agba nke anọ n'asọmpi n'Iko FA. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Ihe nkiri a gbasara ihe ụmụnwaanyị gabigara oge agha Biafra, ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51132545
E kwesiri imeghari ntuliaka eji họpụta Uzodinma - Nnamdi Kanu
Nnamdi Kanu sị na ikpe ụlọikpe Ukwu kpere maka ntuliaka Imo ga-abụ usoro a ga-eji na-ekpe ụdịri ikpe ahụ.
2020-01-16T10:34:07Z
E kwesiri imeghari ntuliaka eji họpụta Uzodinma - Nnamdi Kanu
Nnamdi Kanu Onyeisi otu na-achọ ka ekwewapụta mba ha kpọrọ Biafra na Naịjirịa bụ "Indigenous Peoples of Biafra" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu sị na e kwesiri imegharị ntuliaka nke nyere Hope Uzodinma ohere ị bụrụ aka na-achị Imo steeti. Kanu kwuru nke a n'ozi ọ gbasara n'akara Facebook Radio Biafra London ụnyaahụ. Ọ sị na mmeri Uzodinma site n'ikpe ulọikpe Ukwu Naịjirịa kpere bụ ihe mmegide dịrị ndị Igbo makana ọ bụ ụzọ ndị ọ sị bụ ndi "Fulani" jiri si chọọ ịchị ala Igbo. Hope Uzodinma aṅụọla iyi ọrụ Amụma Mbaka emezuela, Hope Uzodinma emeriela dịka Gọvanọ Imo steeti Ihe Bishop Katọlik gwara Mbaka maka amụma o buru n'isi Hope Uzodinma Ihe ọzọ ọ sị mere ikpe a ekwesịghị ịkwụ bụ makana "ọ ga-abụzị usoro a ga-eji na-ekpe ụdịrị ikpe a site n'atụmatụ Bekee kpọrọ Legal Presedence". N'ịga n'ihu, Maazi Kanu sị: "Ihe e kwesiri ime bụ ịkagbụ ntuliaka a kpam kpam ka ndị Imo jiri aka ha họpụta onye ga-achị ha." Maazị Kanu kwukwara na ọ bụ ezigbote ihe ọjọ mmadụ ibinyere onye masịrị ya aka ma emecha onye ga-emeri abụru onye ahọpụtara n'Abuja. Ọ sị na ọ bụ ihe mere ya jiri sị na "Fulani ewerela ọnọdụ n'Imo steeti." Ọ sịkwa: "Ihe a ha mere n'Imo bụ ụdịrị ihe ha na-eme n'ala Igbo kemgbe, nke bụ ịmanye ndị Igbo eze, dika ndị Briten meburụ na mbụ. Ọ sị na ihe mere ndị mmadụ anaghị eme ngaghari iwe maka ihe na ihe ndi ọzọ bụ maka ụdịrị agwa gọọmentị Naịjirịa kpasịrị Ipob. N'ime ozi ya, Maazi Kanu jụrụ ndị otu ya ma "o nwere ihe oma ga-apụta n'ọchịchị Hope Uzodinma?" Ihe ọzọ o tinyere ọnụ n'ozi a bụ atumatu nchekwa obodo aka na-achịgasị steeti dị iche iche na Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa Hibere. Kanu sị na ya na ndị otu ya ga-enye atụmatụ a nkwado nke gunyere inye ndị Ọdịda Anyanwu ndị mmadụ ga-ensonye na ya bụ atụmatụ. "Atụmatụ bụ ihe anyị chere oge anyị hibere ngalaba anyị kpọrọ "Biafra Secret Service (BSS), ya mere anyị ji akwado ya ọfuma." "Ugbua, ị gaghị anụ maka mwakpo nwaanyị maọbụ mkpa mkpa ndị Fulani n'Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa." Ihe ọzọ o tinyekwere ọnụ bụ ihe ọ sị bụ etu e jiri na-agba ndị Ipob mgba okpuru, nke ọ sị na Facebook, Reuters, Channels TV nakwa BBC Igbo so na ndị na-eme. Dịka o si na-ekwu kwamgbe, Kanu si na ndi ntaakụkọ bu ndị ilo ya na Ipob makana ọ bụghi ihe ọ chọrọ ịnụ ka ha na-ede. Agbanyeghị okwu Kanu kwuru, mkpebi Ụlọikpe Ukwu maka Imo enweghi mgbagha. Ọchịchi Hope Uzodinma abụrụla ihe ga-aga n'ihu ruo afọ anọ etụ ọbụla o siri gaa. Akụkọ ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Nnamdi Kanu", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51132415
Ị ma Chioma Uzodinma; nwunye Gọvanọ Imo steeti?
Akụkọ a ga-agwa gị ihe ndị ị maghị maka onye bụ nwunye Hope Uzodinma bụ gọvanọ Imo steeti.
2020-01-16T10:58:40Z
Ihe i kwesiri ma maka Chioma Uzodinma; nwunye gọvanọ Imo steeti
Chioma Ikeaka- Uzodinma na di new first lady of Imo state, South East Nigeria. Site n'ụbọchị 15 nke ọnwa Jenụwarị 2020, Chioma Uzodinma abụrụla nwunye gọvanọ Imo steeti. Ọtụtụ ndị ma di ya bụ Hope Uzodinma; bụ onye ọ lụrụ n'afọ 2015 ka ọ gbachara nwunye ya nke mbụ alụkwaghịm, mana ụfọdụ amaghị Chioma a bụ onye ga-abụ 'nne mbụ' na steeti ahụ. Rochas Okorocha sị na ya adịghị atụ ụjọ nnyocha Hope Uzodinma Hope Uzodinma aṅụọla iyi ọrụ Amụma Mbaka emezuela, Hope Uzodinma emeriela dịka Gọvanọ Imo steeti Lee ihe ndị BBC Igbo chọpụtara maka nwaanyị a. Ọ na-aza Chioma Ikeaka, tupu ọ lụọ di A mụrụ ya n'ọnwa Disemba afọ 1989, n'ezinaụlọ Humphrey na Beauty Ikeaka Ọ bụ onye Ideatọ dị n'Imo steeti Ọ bụ naanị otu nwa nwaanyị nne ya mụrụ, mana o nwere ụmụnne ndị nwoke abụọ Ụlọakwụkwọ Primarị ya bụ International Early Learning Centre dị n'Aba, Abịa steeti ebe o toro Ụlọakwụkwọ Sekọndrị ya bụ Dority International Secondary School. Ọ gụrụ dịka Ọkaiwu na mahadum Imo steeti (IMSU) Ọ gụkwara n'ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu bụ nke a na-akpọ 'law school' na Bekee, n'Abụja Ọ rụọla ọrụ dịka 'Junior Associate' n'ụlọọrụ ndị ọkaiwu a kpọrọ Emeka Etiaba & Co, nakwa Rickey Tarfa & co na Chris Uche & co. Ndị ma ya sị na ọ naghị enye nsogbu, na ọ na-adị ezigbo nwayọ Ọ mụrụ diọkpara ya n'afọ 2016. ka otu afọ ọ lụchara di gachara Ọ mụrụ ụmụejima nwaanyị abụọ n'afọ gara aga, iji meruo ọnụọgụgụ ụmụ ya atọ. Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ụmụnyanyị", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51166314
Etu ndị Igbo si bido riwe osikapa n'ụbọchị ụka
Ọ ka na-agbagọjụ ọtụtụ ụmụ Naịjirịa anya etu o si bụrụ na ọ bu osikapa ka a na-erikarị n'ụbọchị ụka, mana gịnị jịkọrọ ha?
2020-01-19T13:26:38Z
Sunday rice: Etu ndị Igbo si bido riwe osikapa n'ụbọchị ụka
osikapa Osikapa n'ụbọchị ụka, o na-egbukwanụ oge? Mbanụ ka ndị Igbo ga-aza gị. Ma anyị na-ede akụkọ a, na-elegara anya ka anyị ga-esi riwe osikapa nke ụbọchị ụka. Lee nri ndị e jiri chere ndụ n'oge agha Biafra, ụfọdụ ka a ka na-eri ugbua Ị ma etu esi agwọ abacha? Mụta ya ebe a Ịhapụ iri nri ụtụtụ o nwereike igbu gị n'oge erughị eru? Osikapa bụ otu nrị ụmụ Naịjirịa ejighị egwu egwu tụmaadị ụbọchị ụka. Ha nwere ụzọ ole na ole ha si eri ya bụ nri. Ụfọdụ ndị na-eji ofe akwụ, ofe tọmato, jọlọf, maọbụ eghere eghe wee hazie ya. Kedụ ka o si malite? Ọkammụta n'ihe gbasara nri bụ dọkịta Florence Uchendu kwuru na oriri osikapa ụbọchị ụka na Naịjirịa enweghị ụbọchị a ga-asị na ọ malitere iche. Kama na a na-ahụta ya bụ nri ka nri ndị ọgaranya mgbe gboo mere na mmemme ọbụla ị gara a na-ejikarị ya ele ndị ọbịa mgbe ahụ. O kwuru na ugbua ya bụ nri abụrụla omenaala tụmaadị na mmemme maọbụ ụbọchị ụka ọbụla n'ala Igbo nakwa Naịjirịa. Gịnị kpatara nke a? Dọkịta Uchendu kwuru na ihe ndị a bụ ihe o chere mere ka a na-erikarị osikapa ụbọchị ụka. Ọ dị mfe osisi Ụmụaka ejighị ya egwu egwu ya mere nwata ọbụla na-erighị ya ụbọchị ụka na-eme ka azụ esi na mmiri gụpụta. Ọ bụ omenaala dabaara onye ọbụla Ụzọ niile esi eri ya na-atọ ụtọ O nwere ọghọm dị na ya? O kwuru na o nweghị ọghọm dị ya kama na ebe nsogbu dị bụ ma ọ bụrụ na ezinụlọ ahụ na-eri osikapa ụtụtụ, ehihie nakwa abalị kwa ụbọchị. N'ọnụ ya, "ahụtaghị omenaala iri osikapa dịka nke nwereike ịkwụsị belụsọ osikapa alara kpam kpam." Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe Emeka Ihedioha kwuru maka nchutu ya dịka gọvanọ Ihe mere na ị gaghị echefu izuụka a ọsịsọ Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Nri" ]
https://www.bbc.com/igbo/51159925
Ndi PDP goro ndị mere ngagharị iwe ego - APC Imo Steeti
Onye isi ndị APC, Marcel Nlemigbo. kwuru na Gọvanọ Uzodinma ga-agwa ndị Imo okwu ma e mechaa.
2020-01-19T14:58:33Z
Imo Protest: 'Ndi PDP goro ndị mere ngagharị iwe n'Owere ego' - APC Imo Steeti
Ụmụnwaanyị na-ebe akwa oge ha mere ngagharịiwe Ụmụnwaanyị na-ebe akwa oge ha mere ngagharịiwe n'Owere ụbọchị ụka Otu APC n'Imo Steeti ekwuola na ọbụ ogugo ka ndị PDP goro ndị mere ngagharịiwe n'Owere ụbọchị ụka. Marcelinus Nlemigbo, onyeisi ndị APC na steeti ahụ kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo. Hope Uzodinma aṅụọla iyi ọrụ Aha Uche Nwosu na Hope Uzodinma adịghị n'ime aha Inec wepụtara n'Imo Nlemigbo kwuru na ọbụghị ndị Imo mere ngagharị iwe ahụ kama ọ bụ ndị PDP bara n'ime obodo goro. O kwuru sị: "Mgbe INEC kwuru na ọbụ Ihedioha na ndị PDP meriri ntuliaka, anyị emere ngagharịiwe?" "Anyị ji nwayọ buru okwu anyị gaa ụlọikpe." "Ugbua ụlọikpe nyere anyị mmeri, gịnị ka ha na-emere ngagharịiwe." "Ọ bụ ụmụaka ha (ndị PDP) kwụrụ ụgwọ n'Owere ebe a ka ha ji mee ngagharịiwe ahụ." Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'Owere oge ya ngagharịiwe na-aga n'ihu. Ọtụtụ ndị gwara ya okwu kwuru na obi adịghị ha mma maka nchụpụ a chụpụrụ Ihedioha. Ngagharịiwe na-abịa dịka Emeka Ihedioha kwuru na ya ewerela ihe etu o si hụ ya. Ihedioha kwuru nke a oge ndị isi otu PDP bịara ịleta ya n'Abuja n'ụbọchị Satọde. O kwuru na ya kwenyesiri ike n'ọchịchị onye kwuo uche ya n'agbanyeghị ihe a mere. Mana o kwuru hoo haa na ya bụ ikpe ndị 'Supreme Court' egosipụtaghị mbunuche ndị Imo steeti na ntuliaka oche gọvanọ e mere n'afọ gara aga. Connor McGregor etiwaala 'Slate' Conor McGregor Ọgba mgba a ma ama bụ Connor McGregor emeela ya ọzọ! O jiri naanị ntabi anya iri anọ merie Donald Cerrone na mgba mbụ n'asọmpị UFC kemgbe ọnwa Ọktoba afọ 2018. N'aka ọzọ Onyeisioche ngalaba na-ahụ maka mmanụ agbịdị na Naịjirịa bụ NNPC n'aha ịchafụ Mele Kyari ekwuola na ihe dị iche adịla n'ọrụ ịbelata ndị na-emebi okoporo mmanụ agbịdị nakwa ndị na-ezu ya n'ohi. O kwuru nke a n'akara Twitter ya dịka ọ gara nleta n'ogige ndị agha mmiri dị n'Ojo Legọs. "Emir Potsikum ndo - Buhari" Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigarala Emir Potiskum bụ Umaru Bubaram ozi itiakanobi maka mwakpo ọ gabigara n'aka ndị omekome bu egbe n'okporoụzọ Kaduna na Zaria. Ndị uweojiii kwuru na mmadụ anọ na-arụrụ Emir ahụ ọrụ nwụrụ na mwakpo ahụ. N'Anambra Idemmiri mebisirị ihe ndi mmadu Gọọmentị Anambra steeti adọọla ndị mmadụ aka na ntị maka ịwụnye atịtị n'ime ọwa mmiri dị icheiche na steeti ahụ Ha gwara ndị mmadụ kee nkwụcha maka udu mmiri na'abịa ma kwuo na ọ bụrụ na ndị mmadụ gee ntị ọ ga-enyere gọọmentị aka ịchekwa ndụ na ebe obibi ha. Na mba ofesi, Dịka usoro nchụpụ onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na-aga n'ihu, ndị otu ọkaiwu ya ekwuola na usoro ahụ bụ ịwakpo ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọ bụ n'izuụka na-abịa ka a ga-ebido ikpe ya n'ezie. N'egwuregwu, Anthony Joshua bụ odogwu n'iti ọkpọ agaala ịleta onyeisiala Naịjirịa dịka ọ nọ na mba Briten. Joshua kwekwara ya nkwa ị nọchịte anya Naịjirịa ọfụma ma chekwaa aha ya mgbe niile. Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a Ihe nkiri ga-amasị gị
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Amerika", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51178111
Eburu m ọnụ ọtụtụ ụbọchị maka mmezu amụma Hope Uzodinma - Fada Mbaka
Fada Mbaka ekwuola etu o siri buo amụma o sị mezuru maka ntuliaka Gọvanọ Imo steeti.
2020-01-20T15:24:27Z
Mbaka Prophecy: Ekpere m ekpere, buo ọnụ ọtụtụ ụbọchị ruo mgbe amụma Hope Uzodinma mezuru
Ụkọchukwu na-elekọta 'Adọration Ministry' Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na ya nọ n'ụlọ ekpere ya na-erighi nri ọbụla ganye na Ụlọikpe Ukwu ekwuo na Hope Uzodimma emeriela dịka gọvanọ Imo Steeti. Fada Mbaka onye guzobere ụka ịtụ mmamma maka mmezu amụma o buru ụbọchị 31 nke ọnwa Decemba 2019 kwuru na obi dị ya mma na Hope bụ onye ga-azọpụta ndị Imo steeti. Amụma Mbaka emezuela, Hope Uzodinma emeriela dịka Gọvanọ Imo steeti Ọ ginị mere ude Fada Ejike Mbaka ji ede? Ọchịchi Buhari dị mma - Mbaka Ọ gwara ndị Imo ka ha nye Hope afọ abụọ nke ọ ga ejị dozigharịa obodo ahụ. Mbaka dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha sepụ aka ka ha si akọ ya ọnụ na Soshal midia n'ihi na amụma ya na ebụ bụ ọ natara chi ọbụghị nke a kpara akpa.
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Imo steeti", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51186866
'Enweghị ihe m ji nwaanyị Naịjiria eme kemgbe m nụchara ụtọ nwaanyị ọcha a'
Isa bụ nwokorọbịa dị afọ 26 chọrọ ịlụ Janine Sanchez bụ nwaanyị si mba Amerịka dị afọ 46.
2020-01-21T06:24:22Z
Nigerian Weddings: 'Enweghị ihe m ji nwaanyị Naịjiria eme kemgbe m nụchara ụtọ nwaanyị ọcha a'
Isa Sulaiman na Janine Sanchez nọ ala Isa Sulaiman Panshekara dị afọ 26 chọrọ ịlụ Janine Sanchez bụ nwaanyị Amerịka dị afọ 46 gwara BBC na o nweghi ike ịhụ nwaanyị Naịjirịa n'anya ka ọ nụchara ụtọ nwaanyị a. Gịnị kpatara nke a? "Eziokwu bụ na ụmụnwaanyị anyị amaghị ihe bụ ezigbo ịhụnanya, ma ọ bụghị na ha na-achọ ihe n'aka gị, ọ bụrụ na ogbu oge nwere 'plan'. Mana nwaanyị onye ọcha gwa gị na ọ hụrụ gị n'anya, nwanne, o si ya n'ala ala obi." Ị hụla nwaanyị onye ọcha bu Igbo n'isi? Mịchaa ya ọnụ, gosi ya ịhụnanya taa na-emefughi oke ego Isa bụbụ ọkpụisi kwuru na obere ụjọ bara ya ahụ mgbe ndị Hisbah na ndị ọrụ nchekwa DSS kpọtara ya n'ụlọọrụ ha, mana ọ garuru ọ bụrụ ndụmọdụ ka ha nyere ya n'ihi etu ndị ntaakụkọ si ebugharị akụkọ ya. Isa na Janine zutere onwe ha n'Instagram ebe otu afọ gara aga. "Anyị zutere mgbe m malitere iso ya n'elu Instagram, o tinye foto ya m binye ya aka mmasị m. Mgbe obere oge gatụrụ, m bịa hụ na ụfọdụ ndị a na-eme 'Yahoo yahoo' na-achọ igwu ya chandum, m bịa zigara ya ozi sị ya gbachikwa ndị ahụ nkịtị. "Nke ahụ abịa mee ya ka ọ hụ na mbụ onye buuru ya ihe ọma n'obi. Ọ bụ nke a mere ka ọ malite inwe mmasị ebe m nọ mgbe ahụ. "Anyị si ebe ahụ malite ịkpa ọfụma, na-akpa nkata site n'onyonyo nke ekwentị. Nke ahụ niile kpọtara anyị ebe anyị nọ ugbua." Ịza ajụjụ a jụrụ ya ma ha abụọ ehiela n'otu imeụlọ kemgbe Janine chọrọ ya bịa Kano ụbọchị isii gara aga, o kwuru sị: "Anyị anaghị araghụ n'otu imeụlọ, mụ na ya na-anọgide chi ejie tupu m sị ya ka chi foo. Naanị nke obere a anyị na-eme (ịmakụ onwe anyị na ijide aka) ndị mmadụ na-ekwu okwu ka ọ fọdụzịa ịlaba n'otu imeụlọ." Isa kwuru na ezinaụlọ ya ekwetela ka ọ lụọ Janine, nke bụ na ha ga-agba akwụkwọ na Maachị afọ 2020 a, tupu ya na nwunye ya akwakọrọ lawa mba Amerịka. "Anyị gbachaa akwụkwọ n'ọnwa Maachị site n'amara Chineke, anyị ga-ala mba Amerịka ebe m ga-achọta ọrụ, laghachị ụlọakwụkwọ, makana m kwụsịrị na sekọndrị. Ebukwa m n'obi ịchọta otu egwuregwu m ga na-agbara." Janine na onwe ya kwuru sị na ọ bụ mbụ ya ịbịa Afrịka, ma kwuo na obi dị ya ụtọ maka etu ndị mmadụ si eleta ya. O kwukwara sị: "Ezutela m ihe karịrị mmadụ 100 n'ime ezinaụlọ ya, obi na-atọ m pọlịna pọlina na ha niile ekwekọrịtala ka anyị lụọ. Ọtụtụ n'ime ha ahụtụbeghi nwaanyị ọcha, ha bịara na-emetụ ntutu m aka, na-ejide m aka." Janine bụ osiite na Kalifonịa sị na ọ na-alaghachị Amerịka na Febụwarị tupu ọ lọghachị na Maachị maka agbamakwụkwọ ya. "M na-alaghachị azụ n'ọnwa na-abịa, m ga-alọghachịte na Maachị maka agbamakwụkwọ anyị tupu mụ na ya akwakọrọ laghachi Amerịka." Na ngwụcha, Isa sị na ịhụnanya ya na Janine gosiri na ịhụnanya ziri ezi ka dị n'elu soshal midia, ma gwa ndị mmadụ gaa nwaa ike ha. Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Omume", "Okike", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51187297
2022 World Cup : A gụnyela Nigeria na 'Group C
Ndị omeiwu ahụ nwere ọgbakọ mbụ ha kamgbe Hope Uzodinma weere ọchịchị.
2020-01-21T07:39:41Z
2022 World Cup : E tinyeela Nigeria na 'Group C"
Ndị 'Super Eagles' E tinyeela otu egwu Super Eagles na Group C n asọmpị iji tozuo ị ga Iko Mbaụwa nke ga-amalịte n'ọnwa Oktoba afọ 2020. Mba ha na Nigeria nọ na otu ahụ bụ Cape Verde, Central African Republic nakwa Liberia. Ndị Algeria, Burkina Faso, Niger, Djbouti nọ na 'Group A.' Tunisia , Zambia, Mauritania, Equitorial Guinea, nọ na Group B. Ndị omeiwu itoolu n'Imo steeti amabaala APC Ime ụlọomeiwu Imo steeti Mmadụ itoolu ndị omeiwu Imo steeti a hapụla pati ha mabanye na APC. Nke a na-eme n'ọgbakọ mbụ ụlọ omeiwu steeti ahụ na-enwe kamgbe Hope Uzodinma nke APC banyechara n'oche gọvanọ. Amụma Mbaka emezuela, Hope Uzodinma emeriela dịka Gọvanọ Imo steeti Hope Uzodinma aṅụọla iyi ọrụ Ndị omeiwu ahụ gụnyere: Isu - Ngozi Obiefule Nwangele - Chyna Iwuanyanwu Okigwe - Obinikpa Chidiebere Ideato North - Arthur Egwim Ideato South - Duru Johnson Ohaji/Egbema - Cyriacus Okoro Onuimo - Paul Emeziem Orsu - Ekene Nnodumele Nkwere - Obinna Okwara Okey Onyekanma N'ime ọgbakọ a ka osote onyeisi ndị omeiwu ahụ aha ya bụ Okey Onyekanma nọkwara kwuo na ya agbaala arụkwaghị m. Onyekanma ritukwara dịka onyeisioche kọmiti na-ahụ maka etu ndị ọgbakọ ndị omeiwu si aga. Onyekanma kwuru na ihe ya ji aritu n'ọkwa bụ ka onye si mpaghara Ọlụ were ya bụ oche dịka nkwekọrịta ha nwere sị dị. Akụkọ ọzọ malitere ifegharị na onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti bụ Collins Chiji esila PDP baa APC. Mana nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na nke ahụ abụghị ezie. Anyị amachibeghị ọkada na keke - Gọọmentị Legọs Gọọmentị Legọs akọwaala na ha amachibeghị ọkada na keke ịgba n'okporoụzọ awaraawara nakwa akwa mmiri dị icheiche na steeti ahụ. Nkọwa a na-abịa dịka akụkọ malitere ifegharị na-ekwu na a machiela ha. Kọmishọna mgbasa ozi na Legọs bụ Gbenga Omotoso kọwara na ha ka-naeleba anya n'okw gbasara ọkada na keke mana ha enwebeghị mkpebi ọbụla gbasara ya. Omotoso kwuru na akụkọ gbasara mmachị keke "abụghị eziokwu". Ortom na Fintiri emeriela Ụlọikpe kachasị ekpebiela ikpe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti Benue nakwa Adamawa. Ha kwuru na Samuel Ortom na Umar Fintiri bụ ndị meriri ya bụ ntụliaka n'otu n'otu. Malabu Gọọmentị etiti akpụpụla Mohammed Adoke ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka na iri aka azụ n'okwu gbasara ụmị mmanụ agbidi a kpọrọ 'Malabu oil well'. Adoke bụ onye ji ọkwa Ọkaiwu gọọmentị etiti n'oge Goodluck Jonathan ji ọkwa onyeisi ala. O teela aka gọọmentị etiti boro Adoke ebubo a, mana ọ gbara ọsọ gbaga obodo Dubai. Ndị uwe ojii mbaụwa bụ 'Interpol' mechara nwụchie ya n'ọnwa Novemba afọ 2020 ma kpụlata ya Naịjirịa na Disemba. Mana Adoke ekwuola ugboro ugboro na ya adaghị iwu ọbụla kama na ya mere ihe onyeisiala oge ahụ bụ Jonathan gwara ya ka ya mee. Ọ bụghị naanị Adoke ka gọọmentị etiti gbara akwụkwọ a. Ndị ọzọ gụnyere Aliyu Abubakar, Rasky Gbinigie, ụlọọrụ mmanụ agbidi bụ Shell, ụlọorụ Agip, nakwa ụlọọrụ Malabu. Liman Andimi Ụkọchukwu Lawan Andimi Ndị otu Boko Haram egbuola onye isi otu 'Christian Association of Nigeria' (CAN) nke okpuru ọchịchị Michika dị n'Adamawa steeti. Aha ya bụ Lawan Andimi. Nwunye dibia Boko Haram achịliela aka elu Gọọmenti Naịjirịa ga-atụhapụ ndị Boko Haram Ọ bụ onye ntaakụkọ aha ya bụ Ahmad Salkida kọwapụtara nkea. Salkida kwuru na ndi Boko Haram bepuru Andimi isi, ya na otu onye agha Naịjirịa ọzọ. O kwuru sị: "Andimi bụ onye isi ụka, nna, nakwa onyendu obodo ya." Salkida kwukwara na ọ bụ n'ehihie ụbọchị Monde ka e gburu Andimi. Ndi Boko Haram nwụchiri Andimi oge ha wakporo obodo Michika na mbido ọnwa a. Ha gosiri ya n'ihe onyonyoo ebe ọ na-arịọ ka gọọmentị gbatara ya ọsọ enyemaka. Mana enyemaka ahụ abịaghị. Gọọmentị Naịjirịa ekwubeghi ihe ọbụla gbasara nke a. 'Lassa Fever' Oke na-ebutekarị ọrịa 'Lassa fever' Ọrịa a na-eche na ọ bụ Lassa egbuola ndị dọkita anọ na otu onye ọzọ n'ụlọọgwụ mahadum Aminu Kano nke dị na Kano steeti. Otu n'ime ndị isi ụlọọgwụ ahụ aha ya bụ Imam Bello gwara ndị ntaakụkọ na e zigala ọbara ndị ahụ nwụrụ anwụ ka e nyochaa ya mata kpọmkwem ihe gburu ha. Mkpụrụ okwu 'Oxford Dictionary' nke 2020 Akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford Dictionary' Ị ma na ụfọdụ okwu e jiri mara ndị Naijiria abanyela n'akwụkwọ nkọwa okwu 'Oxford Dictionary' n'afọ 2020? Okwu ndị a gụnyere ọkada, buka, k-leg, agric, danfo, chop chop, barbing salon, dịrị gawazie. Buhari ezutela Boris Johnson Onyeisiala Muhammadu Buhari arịọla mba Briten ka ha nyere Naịjirịa aka nyochaa ndị niile nwere ebubo mpụ na nrụrụaka gbatara ọsọ izendụ na mba ha. Ọ rịọrọ nke a mgbe ya na Praịm Minista Briten bụ Boris Johnson na-akparịtaụka ime ụlọ n'ọgbakọ UK-Africa Investment Summit 2020 a na-eme na Lọndọn ugbua. Kedụ uru Nigeria na Africa ga-erite na Brexit? Mba Briten kwụ Naịjirịa n'azụ n'ụzọ siri ike Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu wepụtara dịka ọgbakọ a na-aga n'ihu. Buhari sị na ọchịchị ya na-agba mbọ n'ibu agha megide mpụ na nrụrụaka ma e nwere ụfọdụ ọgbateuhie dị n'ụzọ. N'otu aka ahụ Buhari gwara onyeisiala Gana bụ Nana Akufo-Addo na ihe o ji gbachie okeala Naịjirịa abụghị naanị maka mbubata nri, kama na ịtụ mgbere ngwaagha na ọgwụike sokwa. Akufo-Addo na nzaghachị ya sị ka Buhari gbapụ ya ọsọ na nyocha banyere nke a n'ihi oke uru Naịjirịa baara Ghana. Gịnị ga-eme n'ụlọomeiwu Imo Steeti Anya niile nọ n'ụlọomeiwu Imo Steeti ugbua dịka ha ga-amalite nzukọ ha nke mbụ n'okpuru ọchịchị gọvanọ Hope Uzodinma. Cheta na ndị a gara ezumike Ekeresimesi n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba 2019, mgbe Emeka Ihedioha ji ọkwa gọvanọ. N'ofesi Ndị ọrụ ahụike na mba Chaịna achọpụtala na ọrịa iku ume a kpọrọ Coronavirus nwereike isi na mmadụ fee na mmadụ site mmekọrịta ahụ. Dịka ọ dị ugbua ọrịa a egbuola ihe ruru mmadụ anọ ebe ọtụtụ ndị gụnyere ndị ọrụ ahụike nọ n'ọnọdụ ọjọọ. Emiliano Sala Emiliano Sala Taa ka o mere otu afọ kpọmkwem ọgba bọọlụ bụ Emiliano Sala lara mmụọ dịka ụgbọelu ya kpọkasịrị oge o si mba Fransị na-aga otu egwuregwu ọhụrụ ya bụ Cardif City. Na mkparịta ụka ya na BBC, Nne Sala kwuru na ọnwụ nwa ya ka na-agbawa ya obi nke ukwu na-agbanyeghị na ọ gaala otu afọ ya bụ ihe mere. Chelsea chọrọ Cavani Onye nchịkọta Chelsea bụ Frank Lampard ekwuola na uche ya dị n'ịzụ Edinson Cavani bụ onye chọrọ isi na PSG pụọ. Lampard sị na Chelsea kwesịrị mwulite ka ha nwee ike tozuo oke n'asọmpi Champions league afọ na-abịa. Nkeji Ihe nkiri
[ "United Kingdom", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51201018
Chelsea na Arsenal adọrọla ka ofe ọkwụrụ gbara ụka
Chelsea na Arsenal nyere onwe ha goolu abụọ abụọ n'asọmppi EPL.
2020-01-21T22:10:15Z
Chelsea vs Arsenal: Chelsea na Arsenal adọrọla ka ofe ọkwụrụ gbara ụka
E nyere David Luiz 'red card' na asọmpi ahụ E nyere David Luiz 'red card' na asọmpi ahụ Arsenal takwutere ya kọnkịrị n'aka Chelsea mana ha gosiri ike dimkpa iji jide onwe ha. Otu abụọ a nyere onwe ha goolu abụọ abụọ oge ha zutere na 'Stamford Bridge' n'aabalị Tuzde. Bournemouth akụnyela Chelsea ikputu ọnụ Nkata ekpudola Arsenal Ndị Chelsea che na asọmpi ahụ ba-abụ ofe nkupu mana ha hụrụ nke tọrọ 'Bịati'. Oteghi aka asọmpi a malitere, David Louis gbaturu Tammy Abraham n'ime obi goolu ha nke mere ka a gbaara ya ụgbọ nwa mkpi ma nye Chelsea penariti. Gorginho gbakpuru penariti ahụ wee gbaara Chelsea aka ahịa. Martinelli nyere goolu dị ebube na asọmpi ahụ Chi ndị Arsenal zọrọ ha oge bọọlụ kụrụ Saka n'aka n'ime '18' mana ogbu opi ahụghị ya. Na nkeji 63, Gabriel Martinelli nyere goolu dị ebube wee saara ndị Arsenal ọnụ ha. Chelsea nyere goolu ọzọ si n'aka Ceaser Azpilicueta. Mana na nkeji 88 ka Bellerin nke Arsenal sakwara ya. Otu a ka ya bụ egwu si bee. Sergio Aguero nyere goolu ndị Manchester City ji merie N'asọmpi ndị ọzọ a gbara n'abalị Tuzde, Manchester city ji otu ọkpụ goolu merie Sheffield United. Aston Villa si azụ owere lọghachi wee merie Watford 2-1. Bournemouth na Brighton gbara 3-1, ebe Southampton meriri Crystal Palace 2-0. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: 2022 World Cup : A gụnyela Nigeria na 'Group C Okada, Buka, K-Leg so n'okwu Bekee Nigeria banyere na 'Oxford Dictionary' n'afọ 2020 Tupu ị gaa China lekwa ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Chelsea", "Egwuruegwu", "Bọọlụ", "Arsenal" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51203625
Ihe anyị ji kpọchie ụlọahịa mmanụ ụgbọala n'Enugwu - IPMAN
Onyeisi otu ndị na-ere mmanụ ụgbọala n'Enugwu kwuru na ọ bụ abụbụ ọrụ ha gbara kpatara 'petrol' ji kọọ ụbọchị Tuzde.
2020-01-22T07:34:13Z
Enugu Fuel Crisis: Ihe anyị ji kpọchie ụlọahịa mmanụ ụgbọala n'Enugwu - IPMAN
Ọdọ mmanụ ụgbọala Ụkọ mmanụ ụgbọala bụ nsogbu ekweghị ala ala na Naịjiria Otu jikọrọ ndị na-ere mmanụ ụgbọala akọwaala ihe ha ji gbaa abụbụ ọrụ n'Enugwu n'ụbọchị Tuzde nke tinyere ọtụtụ ndị mmadụ na gbagharịa. Onyeisi otu a bụ Chinedu Anyaso kwuru na abụbụ ọrụ ahụ bụ iji mee ka Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi mepeere ha ụlọọrụ a kpọchiri akpọchi. Ọdụ mmanụ agbịdị niile dị n'Enugwu gbachiri agbachi Ọzọemela! Tanka ọzọ bu mmanụ ụgbọala adaala n'Enugu state Anyaso kwuru na kamgbe ha batara n'ọchịchị n'ọnwa Nọvemba 2019, isi ụlọọrụ ha kpọchiri akpọchi. O kwukwara na ha edeela akwụkwọ degara ndị uweojii, DSS, nakwa ụlọọrụ gọvanọ, mana onweghị onye ṅara ha ntị Chinedu Anyaso bụ onyeisi otu 'Independent Petroleum Marketers Association' (IPMAN) nke Enugwu steeti Anyaso gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị isi otu IPMAN n'Abuja nyere ha ikike ka ha kpọchịe ụlọahịa 'petrol' niile dị n'Enugwu. Ha machikwara ụgbọala tanka niile bu 'petrol' ịbata n'Enugwu. Nke a mere ka Gọvanọ kpọọ ha oku udo, ma mechaa nye iwu ka a kpọghee ụlọọrụ ha. Boko Haram ga-akwụ ụgwọ ihe ha mere - Muhammadu Buhari Muhammadu Buhari Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buharị akatọọla ogbugbu Lawan Andimi bụ onyeisi ndị ofufe Kraịst n'obodo Michika dị n'Adamawa Steeti, bụ onye ndị otu oyiegwu gburu, na-agbanyeghị na ha gosipụtara na ha chọbụru ịhapụ ya. Buahrị kwuru na ọ ga-agbalị na ndị oyi egwu a ga-erite ụgwọ ihe ha mere n'uju ya. EFCC akpụpụla Mama Boko Haram ụlọikpe Anyị ga-ewe dinta 10,000 n'ọrụ ibibi Boko Haram - Gọvanọ Borno steeti 'Anyị anwuchiela ndị isi Boko Haram 10' - Ndịagha Naịjirịa O tiri ndị ofufe kraịst niile na Naijirịa, ndị otu CAN na ndị ezinaụlọ ya aka n'obi ma sị ka ụwa niile tinye aka ka a kwụsị ndị otu oyiegwu a niile. Ma sịkwa na "Nke a agbaala ha ume dịka ndị gọọmentị na ndị agha Naijirịa imeri ndị otu oyi egwu niile na Naijirịa ma na ọdida anyanwụ Afrịka. Ọzọkwa Mịnịsta nta na-ahụ maka azụmahịa na nrụpụta ihe, Mariam Katagum Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ngalaba na-ahụ maka azụmahịa na nrụpụta ihe ntuziaka ka a rụọ ụlọọrụ ji ihe akọpụtara n'ubi arụpụta ngwaahịa na steeti niile dị na Naịjirịa. Mịnịsta nta na-ahụ maka azụmahịa na nrụpụta ihe bụ Mariam Katagum kwuru nke a ụbọchị Wenezde. Katagum kwuru na atụmatụ ahụ ga-eme ka akụnụba Naịjirịa bawanye, ma mekwaa ka nri dị n'uju n'obodo Naijira na Briten Dịka a na-eme emume UK-african Investment summit Mba Briten na Naijirịa enweela nkwekọrịta itinye ego n'azụmahịa nke ruru otu ijeri naịra na iri ise na atọ na ọma. Ọ bụ na nzụkọ UK-Africa summit na-eme na Lọndọn ugbua ka ndị oji ego achụ ego nke mba UK na Naijirịa nwere nkwekọrịta a. N'Ofesi, Nje Corona Virus na-enye Chịna nsogbu Ọrịa si na nje coronavirus nke sitere na China selite isi na-esinwanye ike dịka ndị na-ahu maka ahụike na mba ahụ kwuru na nje ahụ nwere ikike ịmụba onwe ya, nke ga-eme ka ọ gbasaa n'ike. Ka ọ dị ugbua, ọrịa a egbuola mmadụ itoolu ma gbasaa ruo mba Amerịka,Taịland na Saụt Korịa. N'Egwuregwu Achụpụru David Luiz ma Arsenal mechara meria Ndị otu egwu bọolụ Arsenal sitere ọnwụ wee gbata onye lawa onye Lawa dịka ha zutere Chelsea n'asọmpi Premier League. N'agbanyeghị na ha dị naanị mmadụ iri agba ndị Chelsea zuru ezu, ha gbalịrị ịhụ na ha abụọ jị goolu abụọ abụọ were laa. Eniola Aluko Nwaada Nigeria bụ Eniola Aluko esonyerela ndị otu egwuregwu bọọlụ Aston Villa nke mba England dịka onyeisi nhazi egwuregwu maọbụ 'Sporting Director' na Bekee. Eniola bụ nwanne Sone Aluko onye gbaara ndị otu 'Super Eagles' nke Naịjirịa n'oge gara aga. Mana Eniola bụ ụmụnwaanyị mba Ịngland ka ọ nọchitere anya ha oge ọ na-agba bọọlụ. Akụkọ ga-amasị gị Chelsea na Arsenal adọrọla ka ofe ọkwụrụ gbara ụka Tupu ị gaa China lekwa ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus Okada, Buka, K-Leg so n'okwu Bekee Nigeria banyere na 'Oxford Dictionary' n'afọ 2020 'Enweghị ihe m ji nwaanyị Naịjiria eme kemgbe m nụchara ụtọ nwaanyị ọcha a'
[ "Boko Haram", "Islamic State group", "Naijiria", "Ụkọrọ mmanụ ụgbọala", "Enugu Steeti", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51186868
Lee nri ndị e jiri chere ndụ n'oge agha Biafra, ụfọdụ ka a ka na-eri ugbua
O ruola afọ iri ise a lụchara agha Biafra, mana e nwere ọtụtụ ihe ha ji mere nri oge ahụ bụ ihe ndị a ka na-eri ugbua, kama etu e ji eri ya ka mma ugbua.
2020-01-22T09:23:33Z
Igbo foods: Lee nri ndị e riri oge agha Biafra, ụfọdụ ka a ka na-eri ugbua
Ji a gwọrọ agwọ Nri dị ezigbote mkpa nye ndị dị ndụ, mere na ọtụtụ ga-ejinwu ihe ọbụla ọ dị ha ka ọ ga-abanwu n'afọ mere nri. N'ụwa ugbua, ọtụtụ ndị e nweela ikike ịhọ nri ha ga-eri, ebe ị ga-anụ "ana m eri ji, anaghị m eri ede". Mana oge agha Biafra, n'ihi etu o si raa ahụ inweta nri, ndị mmadụ riri ihe ọbụla ha hụrụ, ma ọ dị ahụ ha mma ma ọ dị njọ. Etu azụ okporoko si bata Naịjirịa n'ihi agha Bịafra Etu ndị Igbo si bido riwe osikapa n'ụbọchị ụka Lee nri ogbenye 10 ọgaranya na-erizi Ụfọdụ nri ndị Igbo anaghị erikawazị Ihe mere bụ na ka agha gachara, ndị Igbo bịara were nri ndị a tụgharịchaa ya, na-esiputa ya etu ọ ga-esi na-atọ ụtọ n'ọnụ. Lee ụfọdụ nri ndị Igbo malitere iri mgbe gboo na ụzọ e si eri ha ugbua: 1) Akpụ (ji akpụ) N'oge agha, a na-abacha azụ akpụ, saa ya mmiri were mmanụ na ụgba gwọọ ya tupu e rie ya Akọwa akụkọ mgbe gboo ghara ịkpọpụta akpụ, mara na onye na-akọ akụkọ ahụ bụ nwa a mụrụ taa. Akpụ bụ nri e nwereike ịkpọ 'ọzọ Igbo ndụ' maka etu e si eri ya mgbe gboo, ọkachasị mgbe agha Biafra bidoro. Nke bụ na oge agha, ndị mmadụ nọ na-eri akpụ na-abaghị ya na mmiri (bụ etu e si eme ya ugbua tupu e rie ya). Ugbua, a na-eri akpụ n'ụzọ dị iche gụnyere ịkwọ garị, abacha, ime eberebe jiakpụ, akara jiakpụ, wdgz. Akara jiakpụ bụ akpụ e ji mmanụ nri ghee nke etinyere nnu na ose 2) Ji Akụkọ ji dịka nwanne ya bụ akpụ (a ga-akpọ otu aha ghara ịkpọta nke ọzọ)? Ji so n'ihe ndị zọrọ igbo ndụ oge gboo ma n'oge agha, ma soro kwa na nri ndị Igbo anaghị eji egwu egwu ugbua. E nweela ụzọ dị iche iche e si emepụta ji maka oriri. A na-asụ ya asụ eji eri ofe, a na-aghụ ya n'ọkụ jiri mmanụ nri rie ya, a na-esikwa ya esi jiri mmanụ nri, ji agwọrọ agwọ, nke eghere eghe, stuu nakwa ihe dị iche iche eri ya. A na-eji ji a ghụrụ aghụ akwa ọbịa 3) Ero Oge gboo, ụfọdụ na-eji ero emere anụ, mana ugbua, ọtụtụ na-eji ya emere ihe e ji atagharị ọnụ n'ime ofe n'agbanyeghi na anụ ga-adịkwa n'ofe ahụ. E nwere ọtụtụ ero dị iche iche, mana ọ bụghị ero niile dị mma oriri Ero na-atọ ụtọ n'ofe mana ọ bụghị ha niile dị mma itinye n'ọnụ, nke a mere na onye amaghị anya ero ekwesịghị ịkpata ero n'ọhịa. E nwere ero a na-akpọ ata-achakaanya, ero nnọọhịa, atakata e loo nakwa ndị nke dị iche iche. O so na nri ndị zọrọ Igbo ndụ, mana ugbua ọ bụghị mmadụ niile ka ọ na-amasị iri ya. Ka ọ dị ugbua, ọ bụghịdị nwaafọ Igbo niile a mụrụ site n'ihe dị ka afọ 1990 ruo ugbua detụrụla ya ọnụ. 4) Ede: N'oge agha, ụfọdụ ndị mmadụ ji akwụkwọ ede mere akwụkwọ nri ha ji agwọ ji Mana ọ dị ka ịchọta agbụsị n'ime akpa nnu ịhụ onye ka na-eji akwụkwọ ede esi ofe ugbua. N'aka ọzọ, mkpụrụ ede na onwe ya bụ ihe na-aga ahịa ma ruo ugbua, dịka a na-eji ya eme ụrị na-eme ka ofe rọọ arọ, ebe a na-eri ụfọdụ n'ime ya eri. Ugbua a na-esi ede esi rie ya etu e si eri ji. A na-esi ede agwọrọ agwọ, ụfọdụ ndị na-eghe ya eghe na-ata ka ihe ntagharị ọnụ a kpọrọ 'cocoyam chips' n'olu Bekee. 5) Akwụkwọ nri: Ụfọdụ akwụkwọ nri ndị Igbo na-eri ugbua malitere oge agha, mgbe nri kọrọ ezigbo ụkọ. Ọtụtụ bụ ndị ha siri na-ejighi nnu na ose, mana ugbua a na-akwọ aka sie akwụkwọ nri ndị a tinye ma anụ ma azụ, ọ na-atọwa ntị. Akụkwọ nri ndị dị ka 'ucheakọrọ' (o yiri akwụkwọ akpụ) bụ nke ọ na-abụ a gbachaa ya n'anwụ ka ọ ghara ịgbarisi, a fọọ ya afọọ ka ọ dị ka onugbu tupu e were ogiri na azụ na ose sie ya. Ọzọ bụkwa nke a ma dịka 'okwe oyibo' (a na-eji ya dịka ụgụ) e ji ya esi ofe egwusi na nke a ma dịka 'ofe osikapa' mgbe ahụ. Ị ma ihe ole na ole e ji ama ofe ndị Igbo? E ji ụfọdụ akwụkwọ mere ọgwụ: A na-eji akwụkwọ mkpụrụosisi ọkwụrụarọ (pawpaw), akwụkwọ mangoro na akwụkwọ lemọọnụ eme ọgwụ e ji agwọ ịba. A na-esi ya esi, ṅụọ ya aṅụọ ma jirikwa ya saa ahụ. 6)Osikapa: Mgbe gboo ọkachasị mgbe agha, a na-enwe ụdịrị osikapa dị iche iche nke gụnyekwara nke Abakaliki. E nwere osikapa ụzọ ụlọ mana makana e nweghi etu e si ticha ya oge ahụ, a na-esi ya etu ahụ kama ọ ga-eji nji ma e sichaa ya. Ugbua a na-esi osikapa n'ụzọ dị iche iche gụnyere 'jọlọf', nke e ghere eghe, nke mmanụ nri, nke stu, nke ofeakwu, ụfọdụ na-ejikwa ofe dịka ofe egwusi eri ya. 7) Anụ: Oge agha a na-eji ụfọdụ anụmanụ gụnyere agwọ, ngwere, oke (ma nke ụlọ ma nke ọhịa), wdgz eme anụ. Ụfọdụ ndị ka na-eri ugbua, mana ụfọdụ na-asọkwa ha nsọ. A na-agwọ anụ agwọ, eghe ya eghe, ahụ ya n'ọkụ amịkpọ ya amịkpọ ma mgbe ahụ ma ugbua. 8) Ọka: Ị jụọ onye ọbụla hụrụ agha Biafra, otu ihe ha ga-akpọ aha bụ 'corn meal', bụ ihe a na-eke ha oge ahụ. Ọ bụ ihe e si n'ọka mepụta. Akụkọ ga-amasị gị: Lee ihe nri na-ada na-ahịa ugbua e mechichara 'border' Etu e si nweta aha ahịa anọ dị n'ala Igbo Uru 12 ọmụ baara ndị Igbo Ihe nkiri a maka ụgba agwọrọ agwọ ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Nri", "Nchekwa nrị", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51203626
Ọsịsa ajụjụ na-agbagwoju gị anya maka mita ọhụrụ - EEDC
Ndị ụloọrụ EEDC azaala ọtụtụ ajụjụ na-agbagwoju ndị mmadụ anya maka ihe gbasara mita ọhụrụ n'Enugwu steeti.
2020-01-22T13:14:26Z
EEDC: Ọsịsa ajụjụ na-agbagwoju gị anya maka mita ọhụrụ
Igwe Mita ọkụ Onyeisi ụlọọrụ 'Enugu Electricity Distribution Company' (EEDC) na-ahụ maka ọkụ latrik aha bụ Okey Nwosu akọwala ihe na-ebute nghọtahie maka mita ọkụ latrik ọhụrụ na steeti ahụ. Ọ kọwara nghọtahie ndị a nile dịka ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ. EEDC: Anyị akpaghị mita ọkụ aka Gọọmentị na ndị Discos na-ama aka onye mere Naịjirịa ejighi nwee ọkụ Gịnị mere e ji chọọ ịgbanwe mita ochie? Nwosu kọwara sị, "Ndi na-ezu ohi ọkụ ekweghị ka anyị na-enweta ego ọkụ anyị zụrụ. Nke a mere na anyị eenwe ike izụta ọkụ ga-ezuru mmadụ niile nke butere na ọkụ anaghị adị etu o kwesịị." " Mịta emela ochie. O nweghị nkwado teknụzụ ọhụrụ ga-enye aka ịgụkọ ọkụ etu onye siri mụọ ọkụ ya." "Anyị enwetaghị akwụkwọ ozi maka mgbanwe mita ochie" Dịka ụfodụ ndi mmadu na-ewe iwe na akwụkwọ ozi mịta ọhụrụ a eruteghị ha, Nwosu kọwara na ọ bụghị mmadụ niile ka atụmatụ a metụtara kama na ọ bụ ndị Mita ọkụ ha ruru igbanwe ka ha zịgara ozi. "Kedụ ihe mere unu ji malite igbanwe Mita ọkụ? " Okey Nwosu kwuru sị, " Mgbanwe mita ọhụrụ a dị mkpa iji kwụsi izu oku latrik bụ ihe kacha ebutere EEDC njọ ahia ma mee ka ha na-emefụ ego. Okey Nwosu bụ onyeisi 'Enugu Electricity Distribution Company' O kwukwara na ihe ọzọ bụ na mịta ochie na-esi ike imezi ma o mebie. NERC ebulibeghị ụgwọ ọkụ latrik ọbụla Ndị ọrụ ọkụ latrik agbaala abụbụ ọrụ " O nwere ihe mita ọhụrụ a ga-eme iche ?" Nwosu sị na Mita nke ọhụrụ a pụrụ iche ma nwee kwa amamihe nke ya nke ga-enyere ya aka ka o gosipụta ohi ọku latrik ma ọ bu nrụrụaka ọbụla. "Kedụ ndị ga-enwezi Mita ọhụrụ a?" "Ọ bụ ndị ahia anyị ga-enwe Mita ọhụrụ a ma sịkwa na onye ọbụla chọrọ ị buru Mita oku a gaa ebe ọzọ ga-agwa ndị EEDC. Akụkọ ka na-abịa Akụkọ ga-amasị gị Lee nri ndị e jiri chere ndụ n'oge agha Biafra, ụfọdụ ka a ka na-eri ugbua Tupu ị gaa China lekwa ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus 'Enweghị ihe m ji nwaanyị Naịjiria eme kemgbe m nụchara ụtọ nwaanyị ọcha a' Eburu m ọnụ ọtụtụ ụbọchị maka mmezu amụma Hope Uzodinma - Fada Mbaka
[ "Naijiria", "Enugu Steeti", "Enugwu", "Ike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51217804
Burnley asụọla Manchester United ka ede ụrị
Mmeri e meriri Manchester United na be ha emeela ka ndị na-akwado ha malite iti mkpu ọzọ ka a chụọ onye nchịkọta ha.
2020-01-23T05:28:53Z
Man United vs Burnley FC: A sụọla Manchester United ka ede ụrị na be ha
Phil Jones na David de Gea Otu egwuregwu Burnley asọghị anya ka ha ji ọkpụ goolu abụọ chara acha zọọ Manchester United aja n'Old Trafford. Goolu Chris Wood nyere na nkeji 39 e ji bido bọọlụ na nke Jay Rodriguez nyere na nkeji 56 zuru imenye ndị Man Utd n'agbanyeghi na enweghi onye a chụpụrụ achụpụ. Liverpool agwọọla Manchester United ka ji mpataka Manchester United so Arsenal alọ ka Ọgbọnọ Sheffield abụrụla anụ kpọrọ nkụ juru ManUtd ọnụ Iwe mmeri a e meriri ha n'azụ ụlọ ha mere ka ndị na-akwado Man Utd malite ịkwa ha emu. Ha kwogidere ha 'wooo!!' oge ha na-apụ n'ọgbọegwuregwu oge a gara ezumiike nkeji iri na ise a na-aga ma a gbachaa ọkara nke mbụ, ma kwokwaa ha ọzọ ka ha na-apụ mgbe a gbazuru bọọlụ. Ha burukwara iwe ahụ gbadata na soshal midia ebe ha na-ekwu '#OleOut' nke bụ ịkpọ oku ka a chụpụ Ole Gunnar Solskjaer bụ onye nchịkọta ha. Mmeri a emeela ka Burnley na Crystal Palace, Arsenal, Everton na Newcastle hara na pọịntị Ihe bu mbụ Burnley na-emeri Man U n'ime ugboro 15 ha na-ezute. Ọ bụ n'afọ 1962 ka ha meriri Man U. Ọ bụ ọkpụ goolu ise asatara abụọ ka ha gbara n'oge ahụ. Marcus Rashford bụ onye egwu Man Utd esoghi gbaa bọọlụ n'ihi ahụ ọ merụrụ, nke ahụ gosiri ọfụma maka etu Man Utd si gbagide ọnyụpa n'egwuregwu a. Ka ọ dị ugbua, Chelsea ka ji pọịntị isii aga ha, ebe Burnley na onwe ha ji ohere ahụ rigote n'ogogo 13 na tebulu. Akụkọ ga-amasị gị Ọrịa Lassa abaala Enugwu steeti Lee nri ndị e jiri chere ndụ n'oge agha Biafra, ụfọdụ ka a ka na-eri ugbua Tinubu etinyela ọnụ na ndọrịtaụka gbasara Amotekun Ihe anyị ji kpọchie ụlọahịa mmanụ ụgbọala n'Enugwu - IPMAN
[ "Kano steeti", "Delta Steeti", "Egwuruegwu", "Premier League", "Australia", "Enugu Steeti", "China", "Manchester United", "Ebonyi Steeti", "Bọọlụ", "Oyi Lassa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51223225
'Ọ bụ obi ọjọọ OBJ,Ezekwesili mere Transparency International ji enye Nigeria aha ọjọọ'
Nnyocha gosiri na ọtụtụ mba egosighị mgbanwe maka imegide nrụrụaka.
2020-01-23T12:32:00Z
Corruption Perceptions Index: Obasanjo,Ezekwesili nyụrụ ihe na-esi- Onye ọrụ Buhari
Olusegun Obasanjo, Oby Ezekwesili na Laureta Onochie Onye nnyemaka pụrụiche nke Onyeisiala Muhammad Buhari bụ Laurette Onochie na-arụ Olusegun Obasanjo na Oby Ezekwesili aka maka ajọ aha nnyocha Transparancy International nyere Naijiria na nsonso a. Nnyocha nke otu na-eme ngụkọ maka ịkwụba aka ọto n'ụwa niile bụ "Transparency International" gosipụta na Naijirịa kpụụ afọ n'ala ada ngụkọ mba na-akwụba aka ọto nke afọ 2019. A ga-akpụpụ Ọkaikpe ukwu Naịjirịa Ụlọikpe? Okonjo-Iweala abụrụla otu n'ime ndị ndụmọdụ na Twitter Ha kwuru na Naịjirịa bụ mba nke anọ ebe nrụrụaka kacha njọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Mana Onochie kwuru na nnyocha ha adabaghị n'ihi na ọ bụ ndị 'iweobi' Obasanjo na Oby Ezekwesili nyụrụ ihe na-esi n'ihi na ọ bụ ha hiwere otu Transparency International. O gara n'ihu gwaa ụmụ Naijria ka ha ghara iji nnyocha ahụ Transparency International wepụtara kpọrọ ihe. "Onyeisiala Buhari bụ onye ọkaibe n'ibu agha megide nrụrụaka n'Afrịka." Na-agbanyeghị na ọchịchị Buhari na-etisi mkpu ike sị na ha na-ebu agha megide nrụrụaka, nnyocha Transparency International kwuru na Naijiria na-agba ọnụba. Mana ya bụ nnyocha na-arụ ngalaba gọọmenti na-ebu agha megide nrụrụaka dịka EFCC na ICPC afọ. N'onwe ya Ezekwesili onye sị okwu Collin Powell tụọ ilu kwuru na ọ bụ kụrụ ka ọ ga-aghọrọ. O kwuru n'akara Twitter sị' "Okwu Collin Powell nke sịrị na 'O nweghị ụzọ nzuzo e si enwe ọganihu karịa nkwado, itinye uchu nakwa ịmụta ihe site na ọdịda' bụ ihe gbatara m n'obi oge m hụrụ nnyocha Corruption Perception Index ọhụrụ." Nrụrụaka n'ọdịda anyanwụ Afrịka: Naanị Chad, Guinea Bissau na Cameroon ka Naịjirịa ka mma Naịjirịa bụ mba nke anọ ebe nrụrụaka kacha njọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Nke a bụ dịka nnyocha ọhụrụ ndị otu 'Transparency International' wepụtara n'ụbọchị Tọzde si kwuo. Naanị Cameroon, Chad nakwa Guinea Bissau ka Naịjirịa ka mma na mpaghara ọdịda Anyanwụ Afrịka. A ga-akpụpụ Ọkaikpe ukwu Naịjirịa Ụlọikpe? Okonjo-Iweala abụrụla otu n'ime ndị ndụmọdụ na Twitter N'Afrịka niile Naịjirịa gbara 33 n'ime mba 48 e nyochara. N'ụwa niile, nnyocha ahụ gosiri na Naịjirịa bụ ndị nke 146 n'ime mba 180. Nke a bụ na-agbanyeghi na ọchịchị Muhammadu Buharị etuola ọnụ na ha ebutuola nrụrụaka na Naịjirịa. Ọ bụ kwa afọ ka ha na-edepụta etu mba uwa niile sị kwuba aka ọtọ Otu 'Civil Society Legislative Advocay Centre' (CISLAC) nke bụ otu na-anọchite anya 'Transparency International' kọwara ihe nrụrụaka jị aka njọ na Naịjirịa. Auwal Rafsanjani, onyeisi otu CISLAC kwuru na gọọmentị etiti ka na-enupu isi nye mkpebi ụlọikpe. Rafsanjani kwukwara na nrụrụaka na ndọrọndọrọ ọchịchị bawanyere na Naịjirịa n'afọ gara aga. Ndị nyere aka na nyocha a Lee ka ụfọdụ mba ndị ọzo bụ agbata Naijirịa sị kwụrụ Ihe gọọmentị kwuru Abubakar Malami bụ Ọkaiwu ukwu gọọmentị etiti Mana gọọmentị etiti ekwenyeghi n'ihe ndị Transparency International kwuru. Ọkaiwu ukwu bụ Abubakar Malami kwuru na otu ahụ ejighi ihe akaebe ọbụla wee mee ya bụ nnyocha. Malami kwuru na ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari emeela ka nrụrụaka gbadata nke ukwu na Naijiria Ọ gara n'ihu maa Transparency International aka n'ihu ka ha gosipụta etu ha si mee nnyocha ha. 'Lassa Fever' ka na-akpa ike Eburula Iba Lasa aribatala n'Enugwu steeti. Onye ntaakụkọ BBC gara ụlọọgwụ Parklane ebe ndị ọrụ nọ na gbagharia dịka orịa lassa Fever gburu otu nwaanyị gbara afọ iri asaa na ise ebe ahụ. Ọrịa Lassa abaala Enugwu steeti Ọrịa Lassa Fever emefuola mmadụ atọ n'Ebonyi Ka ọ dị ugbua, enwetela mkpesa Lassa fever na Ondo,Abia, Delta na Kano steeti. ọrịa a egbuola dọkinta abụọ na nwaanyị dị ime na Kano, mmadụ iri na isii na Ondo steeti, otu nwoke n'Abia steeti. Mmachị obodo Wuhan nke dị na China Nje Corona egbuola mmadụ iri na asaa na mba China Ka akụkọ nje na ọrịa na-aga n'ihu, ndị mba China amachiela mbata ma ọ bụ ọpụpụ na obodo Wuhan maka nje Corona nke na-egbu ndị mmadụ ka ọrịa SARS. Nyocha na egosi na ọ bụ na Wuhan ka ya bụ nje siri bido site na-ire anụ ọhia. Mmadụ iri na asaa anwụọla ebe ihe dịka mmadụ narị ise na iri asaa bụ ya bụ ọria ma otutu ha bị na Wuhan. Ọkụ Ọstrelịa Ọkụ a egbuola otutu mmadụ ma mebie kwa ihe Mmadụ atọ anwụọla dịka ụgbọelu eji emenyu ọku dara na mba Ọstrelịa. Mmadụ atọ a bụ ndị mba Amerịka sọ na mmadụ iri ato na atọ nwurula maka ọku a bidoro gbawa kamgbe ọnwa Seputemba 2019. Dịka ọ dị ụgbụa, amabeghị ihe mere ka ya bụ ụgbọelu daa.
[ "Delta Steeti", "Naijiria", "Abia Steeti", "Australia", "Enugu Steeti", "Mpụ", "Ahụike", "Oyi Lassa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51233283
Amotekun: Ndị Yoroba agakwala n'ụlọomeiwu steeti ime iwu maka otu nche - Nnamdi Kanu
Onye ndu otu Ipob Nnamdi Kanu adọọla ndị ọdịda-anyanwụ aka na ntị ka ghara ị ga ụlọomeiwu ime iwu maka Amotekun.
2020-01-24T07:29:37Z
Nnamdi Kanu: Yoroba agakwala n'ụlọomeiwu steeti ime iwu maka Amotekun
Onye ndu otu Ipob Nnamdi Kanu adọọla ndị ọdịda-anyanwụ aka na ntị sị ha ha chọọ ka okwu Amotekun nwee isi ha agakwala ụlọomeiwu steeti ha ime iwu maka Amotekun. N'ozi ọ gbasara n'abali Fraide, na soshal midia, o kwuru na a ga-eji ndọrọndọrọchị na ego mesaa ndị ụlọomeiwu ha anya ma ekposa ya bụ otu nche. Ihe gọọmentị etiti na ndị gọvanọ Ọdịda-Anyanwụ kwekọrịta maka Amotekun Ihe 5 Allen Onyema gwara Nnamdi Kanu Kanu , onye tụrụ arịrị n'ogbugbu mmadụ ka na-arị elu na Naijria, toro ndị gọvanọ ndị steeti nọ na Ọdịda anyanwụ maka ịtụpụta atụmatụ Amotekun. maka ichekwa mpaghara ha. Ọ gara n'ihu kwaa ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ emo maka ị nọ ịnọ mmadụ mmadụ na-esi mmụọ mmụọ. Ọ gara n'ihu " Ihe ndị Ugwu ji ka anyị mma bụ na eche anyị ego n'ihi anyị ara ụmụ nne anyị ree agbụụ anyị." Brexit: Anyị ga-apụ n'Jenụwarị- Boris Johnson A họpụtala Boris Johnson ka Praim Minista Briten ọhụrụ Boris Johnson ebinyela aka na Mba Briten ga-apụ na EU n'aabalị 31 nke ọnwa Jenụwarị afọ a. Naijiria na mba Macao ga-agbanwerịta ndị nke ha a tụrụ mkpọrọ Muhammadu Buhari e Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka na nkwekọrịta ka Naijiria na Obodo Macao dị n'okpuru China ịgbanwerịta ndị nke ha a tụrụ mkpọrọ. na mba abụọ ahụ. Ozi sị akara Twitter ụlọọrụ onyeisiala kwuru na nke a na-eso nkwubi okwu nke imeobi gọọmenti etiti nwere maka ya bụ okwu n'abalị mbụ nke ọnwa Ọgọst afọ 2018. Ha nọrọ ebe ahụ nọrọ nye ọkaikpe ukwu Naijiria ntụzịaka ka ọ kwado akwụkwọ nkwekọrịta ahụ. Kingsley Moghalu edegarala Ụlọomeiwu Ukwu akwụkwọ mkpesa Kingsley Moghalu Kingsley Moghalu bụbu osote onyeisi ụlọakụ etiti bụ CBN n'aha ịchafụ Kingsley Moghalu bụ nwa afọ zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha otu YPP edegarala ụlọomeiwu Ukwu Naijiria akwụkwọ mkpesa were kpọọ oku ha haziharịa iwu ntuliaka. Moghalu chọrọ ka e me ya iwu iji teknụzụ eme ntuuliaka dịka ịdeba aha,inyocha aha nakwa ikpokọta mpụtara vootu a tụkọtara na ntuliaka. Ọchọrọ ka iwu Naijiria nabata 'smart card reader.' O kpokwara oku ka enye ohere ka ụmụ Naijiria nọ mba ọzọ nwe ike ịtụ vootu ebe ọbụla ha nọ. Na nkọwa ya inwe ntuliaka kwụ ọtọ bụ ihe ga-eweta ezi ntọala nye ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa idinotu Naijiria. Ifeanyị Ubah: Ụlọikpe enyela iwu ka Inec gbaa jim Ifeanyi Ubah Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja enyela Inec iwu ka ha cheregodị n'okwu mkpebi ụlọikpe nyeburu ka achutuo Ifeanyị Ubah dịka Senetọ na-anọchite Anambra South. Cheta na ụlọikpe nke Jọstis Bello Kawu no n'isis ya chụtụburu Ubah maka ebubo iji asambodo NECO adgboroja were zọọ ọkwa Senetọ na ntuliaka e mere n'ọnwa Februwarị afọ 2019. Ifeanyi Ubah ọ baala APC n'ezie? Ka o si kwuru n'ụlọikpe ntuliaka na Naịjirịa Kawu nọkwara n'abali 17 nke ọnwa Jenụwarị afọ jụụ ịkagbu mkpebi e nyeburu n'ikpe ahụ. Grand Slam nke 24 akwaala Serena Williams Serena Wiliams ka na-agba mbọ inweta ntụrụụgo Grand Salm iri abụọ na anọ nke Tenis, oruola mgbe ọ ga-ezu ike? Williams apụọla na asọmpị Tenịs nke Australian Grand slam dịka Wang Qiang meriri ya na-agba nke atọ. Wang jị akara 6-4 6-7 (2-7) 7-5 were merie Williams. Ọ bụ kamgbe 2006 ka agbapụrụ Williams na agba nke atọ na asọmpị Grand slam n'ime afọ iri abụọ na atọ ọ pịawara Lọn Tenisi. Williams emeribuola Wang gbara afọ iri abụo na asatọ n'asọmpị US open na ọnwa Sepụtemba 2019. Williams gbara afọ iri atọ na asatọ na-agba mbọ ịnweta nturu ugo grand slam nke iri abụọ na anọ ya ma Wang abụrụla ya ọgbatauhe. Maka ọkụ Latrik na Naijirịa Ọkụ LAtrik na-anyụ Naijirịa ịkpakụ Gọọmentị Naijirịa na-atụli ma ha a ga-enwụgharị ngalaba niile na-ahụ maka ọkụ latrik n'ihi na kamgbe 2013 enyefere ya n'aka ndị abụghị gọọmentị, ndị Naijirịa nde iri asatọ enwebeghị ọkụ Latrik. Nke a pụtara ihe dịka ha mere nzụkọ National Economic Council n'ụbọchi Tụzde ebe Gọvanọ Kaduna steeti sị na a ga-achọ ụzọ ị dozi nsogbu a ma sị kwa na ngwọta nsogbu a agaghị atọ ọchị. N'Imo steeti Ndị uweojii Ndi uweojii si na ha nwuchiela onye ha si na o bu ya egburu otu nwoke oge ndị isioche ọkpuru ọchichi iri abụọ na asaa mere ngagharịiwe n'imo steeti maka mwepụ ewepụrụ ha? Ha sị na Osuji Sabinus na ndị otu ya kpara mkpa mkpa ga-aga ịzara ọnu ha n'ulọikpe N'Ofesi Nke a bụ maka ndị chọrọ ịga Amerịka mụọ nwa ga-enwe akwụkwọ ikike dịka nwaafọ Amerịka. Onyeisiala Mba ahụ bụ Donald Trump si na atụmatụ ahu abịala na njedebe dịka ha sị na ha agaghị enyezi ụdịri umụaanyi a akwụkwo ha ga-eji baa Amerịka. Akụkọ ga-amasị gị Etu e si eme ka garri ghara ibunye mmadụ ọrịa ịba Lassa Gọọmenti ji aka ha lie nwaanyị ịba Lassa gburu n'Enugwu. Etu e si ama dimkpa Igbo nwere ogologo imi Tupu ị gaa China lekwa ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus
[ "Naijiria", "Donald Trump", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Ike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51217805
Gịnị mere ụmụnwaanyị Naịjirịa ji agbaga US ịmụ nwa?
Donald Trump bụ onyeisiala mba Amerịka na-achọ imachi ụmụnwaanyị na-esi mba ọzọ bịa ịmụ nwa na mba ya.
2020-01-24T10:13:56Z
US Medical: Gịnị mere ụmụnwaanyị Naịjirịa ji agbaga US ịmụ nwa?
Nwa a mụrụ ọhụrụ Nwanne ị ma ihe mere ụfọdụ ndị Naịjiria aga ịmụ nwa n'Amerịka? Ị nwereike ịjụ ihe mere anyị ji ajụ ajụjụ a ma ọ bụrụ na ị nụbeghi na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-akwado imachi ndị na-esi mba ọzọ abịa amụ nwa na mba ya. O kwuru na tupu i tinye akwụkwọ inweta ikike ịbịa Amerịka mụọ nwa, ị ga-egosiputa na ị nwere ego na mmasị ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ gị nakwa gosi onye na-enye 'visa' na gị na dọkịta ekwekọrịtala maka nlekọta gị. Lee ego ole ọ ga-efu gị inweta 'visa' Amerịka Ihe na-akpọga ndị Naịjirịa Dubai Ụzọ ise ụmụnwaanyị Igbo si 'pụọ iche' ebe ndị nke Saudi Arabia nọ N'ihi atụmatụ a bụ ihe Bekee kpọrọ 'anchor baby', ọtụtụ ndị mba ọzọ amụtala ụmụ ji akwụkwọ ikike na-egosi na ha bụ ndị mba Amerịka n'agbanyeghi na ha bụ ndị mụrụ ụmụ ahụ ji akwụkwọ si mba ọzọ. Ọtụtụ ndị Naịjirịa sokwa na ndị a na-aga amụ nwa na mba Amerịka, mana kedụ ihe mere ha na-eji aga? Ihe mere ụfọdụ ụmụnwaanyị Naịjirịa ji amụ nwa n'Amerịka: 1) Nlekọta ahụike ka mma: Priscilla hụrụ onwe ya n'ụlọọgwụ dị na mba Briten kama Naịjirịa dịka o si Amerịka na-ala N'afọ 2017, BBC gosiri etu otu nwaanyị Naịjirịa si mụọ ụmụejima anọ n'ọdọụgbọelu dị na mba Briten ka o si Amerịka na-alaghachi Naịjiria makana a chụghachịrị ya azụ. Ka ọ mụchara nwa, o jide ụgwọ ruru paụnd puku narị atọ na iri atọ. Nwaanyị a kwuru na dọkịta ya gwara ya na ọ ga-akara ya mma ịmụ ụmụ ya ndị a n'ala Bekee; ebe e nwere ụlọọgwụ dị mma ebe a ga-enwe ike ilekọta ya ọfụma. N'ihi ezigbo ụlọọgwụ na nlekọta ahụike ka ọtụtụ ndị na-eji achọ ka ha gbaga Amerịka gaa mụọ nwa. 2) Ịnata akwụkwọ ikike: Ihe ọzọ na-eme ka ndị mmadụ na-agbaga Amerịka ịmụ nwa bụ ka nwa ha nwee ikike ịza onye Amerịka. Onye ọbụla ma na onye ọbụla ji akwụkwọ ikike njem Amerịka bụ passport' na Bekee, abụrụla onye mba ahụ; otu ụzọ na-araghị ahụ iji nweta ya bụ ịbụ onye a mụrụ n'ala ahụ. Uru dị na ya nye gị bụ nne na nna si mba ọzọ mụọ nwa ebe ahụ bụ na nwa gị tozuo afọ iri na asatọ (18), o nwereike itinye akwụkwọ n'aha gị ka gị na onwe gị nweta akwụkwọ ikike ịbụkwa onye mba ahụ. 3) Ọ bụ ihe 'nganga': Ụfọdụ ndị agaghị ekwe akpọ okwu aha, mana ihe mere ha jiri gaa mba Amerịka ịmụ nwa bụ ka ha nwee ihe ha ga-eji tuo ọnụ ma ọ bụ nyaa isi. N'ihi ohere ime "ị makwa ndị anyị bụ", ụfọdụ na-ebiri ego ha ga-eji gbaga mba Amerịka mụọ nwa. Ụfọdụ oge, ndị Amerịka na onwe ha agbasaala akụkọ na-egosi na ụfọdụ ndị abịala mụọ nwa ma jide ụlọọgwụ ndị Amerịka ụgwọ. Mụọ ozi na-agbapụta ndị agaghị akwụnwụ ụgwọ n'ụlọọgwụ Lee ụfọdụ ndị a ma ama na Naịjiria mụrụ ụmụ ha n'Amerịka: 1) Kenneth Okolie 2) Daniel K Daniel 3) Ruth Kadiri-Ezerika Akụkọ ndị ga-amasị gị: Etu e si ama dimkpa Igbo nwere ogologo imi Coronavirus vs Lassa: Ihe e ji ama onye na-arịa ọrịa ọjọọ abụọ a Etu e si eme ka garri ghara ibunye mmadụ ọrịa ịba Lassa Gọọmenti ji aka ha lie nwaanyị ịba Lassa gburu n'Enugwu Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Ezinụlọ", "Naijiria", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50485055
Burna Boy ọ ga-abụ onye Naịjiria mbụ ga-erite Grammy?
Emume nturuugo Grammy nke afọ 2020 amalitela, ndị Naịjirịa ga-ama ma Burna Boy ọ ga-abanye n'akụkọ agaghị echefu echefu.
2020-01-26T08:53:39Z
Burna Boy ọ ga-abụ onye Naịjiria mbụ ga-erite Grammy?
Burna Boy Emume Grammy nke iri isii na abụọ ehibere n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Jenụarị na-ebiri ọkụ na Los Angeles dị na mba Amerịka. Ụmụ Naịjirịa nọ n'elu twitter na-egosi obi anụrị ha na 'Burna Boy' nke Naịjirịa so na ndị nwereike inweta ya bụ nturugo. Burna Boy agbaala n'ihe emume Trevor Noah Ihe iribama mere na #SoundcityMVP 2019 Ụfọdụ n'ime ha na-ekwu ihe ha ga-eme ma ọ bụrụ na o merie . @CalebChom na-ekwu ego ọ ga-enye maọbụrụ na Burna mabute Grammy @FreedomOghenero na-ekwu na obi siri ya ike na Burna ga-amabute ihe nrite a. Cheta na Burna Boy nke Naịjirịa so na ndị nwereike inweta ntụruugo kachasị n'egwu bụ Grammy. E debanyere ọbaegwu ya ọ kpọrọ 'African Giant' n'ogogo ndị nwereike inweta 'ọba egwu kachasị mma n'ụwa' nke bụ 'Best World Music Album na Bekee'. Bruno Mars nwetere nrite 6 na Grammy Uwe ụmụnwaanyị bịara Grammy yi ga-atụ gị n'anya Ladysmith Black Mambazo eriela Grammy Nke a ga-eme ya mbụ Burna Boy ezigbo aha ya bụ Damini Ogulu, na-abanye na ndị nwereike irite nturuugo Grammy a. Mana ọ bụghị ya bụ onye Naịjirịa mbụ na-enweta ohere a; ndị dịka King Sunny Ade, Fela Kuti, Femi Kuti na ndị ọzọ. 'Soshal midia bill' Gị na-eji soshal midia achọ ndị mmadụ okwu, ị nwereike ịbanye na nsogbu ma e tinye iwu a. Ị chetara iwu megidere okwu akpọmasị ndị ụlọomeiwu ukwu tiputara n'izu gara aga nke a sị na ikpe ya bụ ikpe ọnwụ? E bufekwaala ya ngụpụta nke abụọ ugbua. Obiano na-akasi ndị ahịa Ọchanja obi Aka na-achị Anambara steeti bụ Willie Obiano etiela ndị ọkụ gbara ihe ha n'Ọchanja metụtara aka n'obi ma kwuo na enweghị ụdịrị ego ọ sọrọ ya bụrụ, nwereike ịkpọghachite ndị nwụrụ anwụ. Obiano kwuru nke a ka o du ụfọdụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'Anambara steeti gaa ekpere maka akwamozu nne na nna nwa ọkụ ahịa Ọchanja ahụ gbagburu. Jose Mourinho ga-anọ Tottenham ruo 2020-23 Jose Mourinho ndị Tottenham ka were n'ọrụ, ga-anọ ebe ahụ ruo afọ 2022 na 2023 ma ọ bụrụ na o metaghị ihe e ji chụọ ya. Mourinho na onwe ya kwuru na ọ bụ ụdịrị ndị ọgbabọolụ nọ n'otu ahụ mere akpịrị ogologo isonye otu a. Akụkọ mere ugbua bụ na Jose Mourinho abụrụla onye nchịkọta otu egwuregwu Tottenham Hotspur dịka a chụchara Mauricio Pochettino. Mourinho bụbu onye nchịkọta Manchester United na Chelsea tinyereaka n'akwụkwọ ịnọ n'ọkwa na ngwụcha afọ 2022 ruo 2023. Tottenham esepụla Mauricio Pochettino oche n'otele Tottenham emeriela Rochadale Mourinho sị na ụdịrị ndị ọgba bọọlụ Tottenham nwere na-enye ya obi aṅụrị nke ukwuu. Onyeisioche ndị Tottenham bụ Daniel Levy sị " N'ime Jose anyị nwere onye so n'otu ndị nchịkọta kachasị mma na bọọlụ" Cheta na Tottenham chụrụ Mauricio Pochettino n'ọrụ agbanyeghi na o du ha ruo agba nke ikpeazụ asọmpi champịọns league n'afọ gara aga. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya Harry Kane bụ onye ndu ndị Tottenham sị na ọ na-abatara Mourinho n'otu ha Matt sị ka a na-atụ anya Bale ịbịa Tottenham ugbua Josephine ugwu atụrụla ugwu Nwada Josephine Ugwu turuugo pụrụiche n'aka onyeisala Buhari maka ego ndị mmadụ furu efu ọ na-eweghachite azụ n'ọdọụgbọelu dị ịche iche na Naịjirịa. Nwaanyị na-arụ ọrụ ihicha ụlọ weghachịrị ọtụtụ nde maịra ego. N'ofesi Mba Izrel akwala mgbọ na mba n'ọtụtụ ebe na mba Siria megide gọọmentị Siria nakwa ndịagha Ịran. Ndịagha Izrel sị na nke a bụ na nzaghachị ọtụtụ ogbunigwe ndịagha Iran gbara n'Izrel. Nkeji ehihie Buhari sị ka ehiwe ụlọikpe pụrụiche maka mpụ Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola ndị ụlọomeoiwu ka ha gbapụ ya ọsọ n'itinye iwu ga-ehiwe ụlọikpe ga-elebanya na mpụ ndị pụrụiche. Ọ kpọrọ oku a n'ọgbakọ e mere iji belata nrụrụaka n'etiti ndị na-arụrụ ọha ọrụ bụ ebe ọ rịọrọ ndị ọkaikpe ka ha nabata atụmatụ a. Buhari ebinyela aka n'iwu #NotTooYoungToRun Ụkọchukwu a sị wakporo nwaanyị n'ike A nwụchiela nwoke ahụ kụgburu nwunye ya Ndị uweojii Enugwu steeti agbaala otu ụkọchukwu n'anwụ n'ihi ebubo ịwakpo otu nwaanyị n'ike nakwa ịkwọ ọgwụ ego. Komishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ahmed Abdur-rahman kwupụtara nke mgbe ọ na-agba mmadụ iri atọ na isii ndị ọzọ n'anwụ maka mpụ dị iche iche. Otu nwoke egbuola nwunye ya n'Enugwu Ndịagha mba Amerịka abụọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu helikọpta mere n'Afghanistan n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Nọvemba. A ka na-enyocha ihe kpatara nke a mana ndị oyi ndụ egwu kwuru na ha gbaturu ụgbọelu helikọpta ndị Amerịka na mpaghara Logar. Nkeji Ihe nkiri
[ "Chelsea", "Amerika", "Manchester United", "Bọọlụ", "Abụ", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51251701
Ihe asaa ị kwesiri ịma maka Kobe Bryant
Ọtụtụ ndị mmadụ n'ụwa niile gburugburu na-eru uju maka Kobe Bryant onye nwụrụ n'ụbọchị Sọnde n'ihe mberede ụgbọelu.
2020-01-26T20:04:45Z
Kobe Bryant: Ihe asaa ị kwesiri ịma maka nwoke a
Kobe Bryant Kobe na nwa ya nwaanyị gbara afọ iri na atọ bụ Gianna so n'ime mmadụ itoolu nwụrụ na mberede ụgbọelu n'obodo Kalabasa dị na Kalịfonịa. Bryant nwụrụ n'afọ iri anọ na otu, ọtụtu ndị mmadụ nke gụnyere Barack Obama na ọtụtụ ndị ọzọ na-eru uju maka ọnwụ ya. Kobe Bryant na nwa ya nwaanyị Bryant bụ onye egwu bọọlụ nkata a ma ama n'ụwa niile. Nna ya bụ Joe Bryant tụkwara bọọlụ nkata n'agba NBA nke mba Amerịka. Lee ihe ise ịkwesiri ịma maka Kobe Bryant 1. Kobe Bryant turu ugo dịka onye kachasị n'egwuregwu bọọlụ nkata nke mba Amerịka ugboro ise 2. Ọ tụụrụ ndị otu Los Angeles Lakers bọọlụ afọ iri abụọ (20). 3. Bryant lara ezumike nka n'afọ 2016. 4. Ọ bụ kwa onye kachasị n'egwuregwu nkata bọọlụ nke afọ 2008. 5. Ọ bụ naanị ya bụ onye nweterela akara narị iri atọ (300) n'afọ iri atọ na anọ (34). 6. Kobe Bryant eturukwala ugo n'emume ndị kacha mee ihe onyonyo nke "Oscar" maka ihe onyonyo o mere nke a kpọrọ "Dear Basketball". 7. N'afọ 2003 ka e boro ya ebubo ịwakpo nwaanyị kama e mechara tụghapụ ya bu ikpe n'ụlọikpe. Ihe ikpeazụ o kwuru n'akara Twitter ya bụ ikele ogbo ya bụ Lebron James maka ịgafe ya n'ọkwa. Ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ọnwụ Kobe Bryant Barack Obama Donald Trump
[ "Egwuruegwu", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51273067
Southeast Politics: Mbaka, ị bụghị onye Yahoo Pastor - Charly Boy
Onye oti egwu a ọnụ na-eru n'okwu si ka agbaa mbọ hụ na ndị na-achị ereghị obodo were ego maa n'akpa.
2020-01-27T16:30:59Z
Southeast Politics: Mbaka, ị bụghị onye Yahoo Pastor - Charly Boy
Charly Boy bụ otiegwu a ma ama na Naịjirịa, ma bụrụkwa onye ọnụ ya na-eru n'okwu banyere ihe na-eme na Naịjirịa, ọkachasị ebe ọ na-emetụta etu ndị na-achị si achị. Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Charly Boy dụrụ ndị a na-achị ọdụ ma sị ka ha gbado anya n'etu e si achị ha nakwa hụ na ndị na-achị mba Naịjirịa jidere ha ọfọ. Gee ya ntị n'ihe nkiri dị n'elu. Akụkọ ga-amasị gị Charly Boy: Ndị ọjọọ na-achị Naịjirịa Ọ bụ sọ Mbaka ka Chineke na-agwa okwu? - PDP Imo steeti Nnamdi Kanu ekwuteghi ya, Naịjirịa abụghị 'zoo' - Charly Boy Oge eruola mgbe ụmụ Igbo ga-edozi ala Igbo - Charly Boy Eburu m ọnụ ọtụtụ ụbọchị maka mmezu amụma Hope Uzodinma - Fada Mbaka
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "West Africa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51270177
Ihe ọghọm dị n'ịgbali egbe elu n'ebe a na-eme emume
Ọ bụghịzi ihe mbụ na ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla site na mgbọ egbe tụrụ ha dịka a gbaliri egbe elu.
2020-01-27T17:42:45Z
Gun Salute: Ihe ọghọm dị n'ịgbali egbe elu n'ebe a na-eme emume
Gun men 'A sị na ihe ọbụla lara elu ga lọtarịrị n'ala', etu a ka ọ dị mgbọ egbe a gbaliri elu. Ọtụtụ mgbe ndị ọrụ nchekwa na ndị ọzọ na-adị agbalikarị egbe elu n'obi aṅụrị karịsịa ebe a na-eme emume. Uweojii n'Enugwu anakọsịala ndị mmadụ egbe Ogbaghara adaala na Pọtakọt Ụdị agwa a ebutele ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ dịka mgbọ egbe a gbaliri elu tụrụ ha. Otu n'ime ndị nwụrụla a na-eche na ọ bụ n'ihi ịgbali egbe elu a bụ Ndubuisi Emenike, bụ onye pati All Progressives Congress (APC) n'Imo Steeti. Ọ nwụrụ site na mgbe tụrụ ya oge otu onye ọrụ nchekwa gbaliri egbe elu dịka ha na-aṅụ ọṅụ na mmeri nwada Princess Miriam Onuoha meriri na ntuliaka. N'ihi nke a, ka anyị lebanya n'ọghọm ndị dị n'ịgbali egbe elu. Kedụ ihe na-eme ma a gbalie egbe elu? Otu onye ọkachamara n'ihe banyere egbe na mgbọ bụ David Dyson sị na mgbọ egbe a gbaliri elu na a ga ogogo dị anya. Mana a naghị ama ebe ọ ga-ada, ohere dị na o nwereike ibute mmerụ ahụ maọbụ ọnwụ. Aka akparala onye Fulani ọchịehi bu akpa mgbọegbe akpagharị Nyocha kwuru na agbanyeghi na ọsọ mgbọ egbe ji ada n'ala dị nta karịa nke o ji gbalie elu mana o nwereike ibute ọnwụ. N'ihi nke a ọtụtụ obodo dị n'ụwa dịka Califonịa, Texas, Arizona amachiela ndị mmadụ ịgbali egbe elu. Ihe mere ndị mmadụ ji agbali egbe elu Mgbọegbe Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Orlando Ikeokwu sị dịka omenala ndị si dị na a na-ahụta ya dịka nkwanye ugwu. Na ọ bụ mkpọnala ka a na-agbakarị mana ugbua ndị mmadụ malitere ịgbali egbe elu karịsịa ndị ọrụ nchekwa. Aka akparala nwoke na-arụpụta egbe na-eresi ndị omekome n'Enugu O kwuru na nke a adịghị mma na o nwereike igbu mmadụ na ọ bụ imefu ngwa agha e kwesịrị iji rụọ ọrụ. Orlando si n'agbanyeghi na o nweghi iwu machiri ịgbali egbe elu na Naịjirịa mana e nwere ike ịkpọpụ mmadụ ụlọikpe maka ime ụzụ na ihe ndị ọzọ.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51292739
Ọkụ na-agba na Balogun alala ọtụtụ ụlọ na ngwaahịa n'iyi
Ọkụ na-erepịa ngwaahịa ndị na-ere ahịa dịka ha na-agba mbọ ịzọpụta ọtụtụ ihe na Legọs Aịland.
2020-01-29T11:27:19Z
Balogun Market Fire: Ụlọahịa abụọ adala n'ihi ọkụ n'agba na Balogun
Ọnụ na-ekwuru ndị orụ gbatagbata na Legọs bụ Nosa Okunbor gwara BBC na ụlọahịa abụọ adala n'ihi ọkụ gbara n'Anambra Plaza dị na Balogun na Legọs. Anya hụrụ ka o si mee sị na ọkụ a malitere mgbe o ji ọkara gafee elekere itoolu nke ụtụtụ a. Ụlọ na-agba ọkụ n'ahia Balogun, Legọs E menyụọla ọkụ ọgbụgba n'ahịa Ogbete Ọkụ a butere ọgbaghara n'ahịa Balogun ebe ndị mmadụ na-agbalị ịzọpụta ngwaahịa ha. Onyeisi ndị ọrụ gbatagbata bụ Lasema Oluwafemi Oke-Osanyitolu sị na Amabeghị ihe butere ọkụ a kama na onwereike ịbụ ọnọdụ ihueluigwe. Ọ sị na ndị ọrụ ya nakwa ndị ọrụ mgbanyụọkụ na-agba mbọ imenyụ ọkụ ahụ ma rịọ ka onye ọbụla dere duu. Cheta na nke a ga-eme ya ugboro abụọ n'ime ọnwa atọ ọkụ na-agba na Balogun dị na Legọs Island. Kirie ihe a ka ị chọpụta ụlọọrụ ndị mgbanyụ ọkụ dị nso n'ebe ị nọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Anambra steeti ga-ebido inye ndị lụrụ agha ọgwụgwọ n'efu Otu onye ọzọ eburula ọrịa Lassa Fever n'Enugwu Ọrịa e jibu mara ndị okenye ndị ntoroọbịa na-arịazị ugbua
[ "Legọsị", "I gosi ahịa", "Naijiria", "Ahịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51292735
Onye e che na o bu coronavirus bata n'Ivory Coast ebughi ya n'ezie - Ministri ahụike
Onye a na-enyo enyo bu coronavirus n'Ivory Coast gosiri na o bughi dịka e mechara ya nyocha.
2020-01-29T13:30:30Z
Coronavirus Outbreak: Onye e che na o bu ya bata n'Ivory Coast ebughi ya n'ezie
Ndị ọrụ ahụike bu igbe ka ha si ụlọọgwụ Jinyintan ebe a na-elekọta ndị a chọtara ọrịa coronavirus, apụta Ihe ruru mmadụ iri na ise bụ ndị ọrụ ahụike ebutela ọrịa n'obodo Wuhan Nwata akwụkwọ e che na o bu coronavirus si Cahịna bata Ivory Coast mechara ọ bụrụ na o bughi ya. Mịnịstry ahụike na mba Ivory kwuru na nwata bụ enyocharala ahụ ma chọpụta na o bughi ọrị a n'ezie. Tupu ị gaa China lekwa ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus Anyị ebidola inyocha ndị njem maka nje 'coronavirus' - FAAN Dịka ọ dị ugbua nwata alakwurula ezinaụlọ ya n'ahụike nakwa izuoke. Nke a na-egosi na ọrịa ọjọọ a marala ụkwụ n'ọtụtụ mbaụwa abatabeghi mba Afrịka chaachaa. Buhari gbaa arụkwaghịm n'ọchịchị - Abaribe Sịnetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye ndu ndị sinetị kachasị nta agwala onyeisiala Buhari ka ọ rịtuo n'ọchịchị ya n'ihe ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa. O kwuru nke a na nzukọ ha n'ụbọchị Wednezde mgbe ndị omeiwu na-atụgharị uche n'ọnọdụ nchekwa ma kpọọ oku ka a hazigharịa obodo. Akụkọ kachasị taa: Ihe Abaribe gwara Buhari 'A gaghị m etinye ọnụ n'okwu N100m ụlọikpe sị anyị kwụọ'-Abaribe Abaribe sị na ihe o ji kpọọ oku a bụ maka na Buhari amala afọ n'ala n'ihe banyere nchekwa nakwa ihe ndị ọzọ Naịjirịa kamgbe ọ bara n'ọchịchị. Ndị Sịnetọ ndị ọzọ gara n'ihu kwuo ka Buhari chụọ ndị isi ngalaba nchekwa dị iche iche na Naịjirịa. E buliela ego ọnwa ndị NYSC Gọọmentị etiti sị na ha ga-amalite ịkwụ ndị ji otu afọ efe ala nna a kpọrọ NYSC n'ịchafụ ego dị puku naịra isi atọ na atọ dịka ụgwọ ọnwa. Onyeisi ngalaba ahụ bụ Brig. Gen. Shuaibu Ibrahim sị na ụgwọ a ga-amalite na-egbughi oge dịka o si na eko mkpata na mmefu nke afọ 2020. N'ofesi Mba Palestine ajụla atụmatụ onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump wepụtara maka ime udo na mpaghara Middle East. Trump sị na Jerusalem ga-abụ isiobodo ndị Izrel ebe ọwụwa-nyanwụ Jerusalem ga-eso bụrụ nke Palestine. Mana onyeisiala Palestine bụ Mahmoud Abbas sị na anaghị ere Jerusalem ere. N'egwuregwu N'egwuregwu Tennis, Dominic Thiem meriri Rafael Nadal ma gbochie ya ịgafe n'agba nke ikpeazụ n'asọmpi Australian Open na-aga n'ihu ugbua. Nkeji Ihe nkiri 'Anyị achọghị Iyaloja na Babaloja n'ahịa anyị' Ndị Igbo na-azụ ahịa n'Odunade na Legọs egosila iwe ha maka atụmatụ Iyaloja na Babaloja a chọrọ ịmalite n'ahịa ahụ. Otu onye na-azụ ahịa n'ebe ahụ bụ Emmanuel gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ bụ ụzọ a chọrọ isi nara ha ụgwọ ụtụisi ugboro abụọ. 'Itinye 'Iyalọja' na 'Computer village' bụ iji kpachapụ Ndigbo' Ndị ahịa Computer Village sị na ha achoghị Iyaloja na Babaloja Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo na-agba mbọ i nweta ndị isi ahịa na ndị okpuruọchịchị ka ha tinye ọnụ n'okwu a. Cheta na otu ihe a mere na ndị na-ere ahịa na 'Computer Village' dịkwa na Legọs. #JusticeforChima Chima Ikwunado nwụrụ n'ebe ndị uweojii jichiri ya #JusticeforChima na-ewu n'elu soshal midia dịka ndị mmadụ ji ohere ahụ a kpọ oku ka-enwetara Chima nwụru n'aka ndị uweojii ikpe ziri ezi Ndị uweojii boro ya na ụmụ nwoke anọ ndị ọzọ ka nọ n'ime mkpọrọ ebubo izu ohi nke ha gbara mbọ gọnarịa. Coronavirus eburula bata 18 Ụlọọrụ ụgboelu British Airways amachiela njem niile na-aga mba Chaịna nakwa ndị si ebe ahụ apụtakwa n'ihi egwu ọrịa Coronoavirus Dịka ọ dị ugbua, ihe karịrị mmadụ narị anwụọla site n'ọrịa a. Ọ pịa ọkpọ bụ Anthony Joshua a ga-eme ka Mohammed Ali si me? Onye na-ahaziri Joshua ọrụ ekwuola na ọ na-akwado ị lụ ọgụ na mba Kongo dịka Ali si me. Ọ bụ ebe ahụ ka Mohammed Ali nọ kụpụ George Foreman ọkwụrụ n'anya. Akụkọ ụwa n'otu nkeji Anambra steeti ga-ebido inye ndị lụrụ agha ọgwụgwọ n'efu Aka na-achị Anambra steeti bụ Willie Obiano enyela iwu na ndị agha niile lụrụ ọgụ n'agha Biafra ga-ebido ị nata ọgwụgwụọ n'efu na steeti ahụ. Ha kwuru na mere nke a iji nyere ndị agha ahụ enyemaka ma cheta kwa agha Biafra biri n'afọ iri ise gara aga. Ihe ndị mere Igbo ejighị Odumegwu Ojukwu, enyi Biafra egwu egwu Kọmishona mgbasaozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba gara n'ihu kọwaa na a ga-ebido ngụkọ na ndenye aha ndị a iji mata ole ha dị. Ịba Lassa ataala is mmadụ 41 kemgbe 2020. N'aka ọzọ Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ site n'ọrịa Iba Lassa eruola iri anọ na otu. Minista ahụike bụ Osagie Ehanire kwukwara na mmadụ narị abụọ na iri ise na asaa bụ ọrịa ahụ na steeti iri na itoolu ugbua n'ala Naịjirịa. Na mba ofesi Ihe ruru mmadụ iri na ise bụ ndị ọrụ ahụike ebutela ọrịa n'obodo Wuhan A na-enyocha mmadụ anọ na mba Itiopia maka egwu na ha bu nje Coronovirus. Gọọmentị mba ahụ agbachiela ndị mmadụ ahụ gụnyere ụmụakwụkwọ atọ n'otu ebe dịka ezigara ọbara ha mba Saụt Afrịka maka nyocha. N'egwuregwu, Ọ ga-akpọtụ na Manchester taa dịka ndị ekwensu ọbara na Manchester ga-achịpụ ya taa n'asọmpị EFL Cup Cheta na otu Man City ji point atọ gafee otu Man United site n'asọmpị ndị ha gbaburu ochie. Gee akụkọ n'otu nkeji ebe a
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51298927
Million, Billion na Trillion bụ gịnị n'Igbo? Lee ihe ndị mmadụ zara
Million, Billion na Trillion bụ okwu mmadụ niile na-anụ mgbe niile mana gịnị ka a na-akpọ ya n'asụsụ Igbo?
2020-01-29T14:20:21Z
Igbo Language: Million, Billion na Trillion bụ gịnị n'Igbo?
Ọnụọgụgụ bụ ihe dị oke mkpa n'asụsụ Igbo. Nke a mere BBC Igbo ji gakwuru ndị na-azụ ahịa n'Abuja ka ha tụgharịa ụfọdụ ọnụọgụgụ n'Igbo. Ọnụọgụgụ ndị dịka 'Million', Billion' na Trillion' bụ ego a na-akpọ n'azụmahịa, mana mmadụ ole ma ihe a na-akpọ ya n'asụsụ Igbo? Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ị ma asụ Igbo? Gịnị bụ 'Cricket' n'asụsụ Igbo? Ị ma asụ Igbo? Gịnị bụ 'Blue' n'Igbo?
[ "Asụsụ", "Naijiria", "Omenala", "Stọk maketi", "Abuja" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51306596
Abaribe kwesịrị ịnọ nga maka Nnamdi Kanu - Garba Shehu
Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu sị na Sinetọ Enyinnanya Abaribe enweghị ohere ịsị ka nna ya ukwu rituo n'ọkwa.
2020-01-30T06:01:37Z
Abaribe kwesịrị ịnọ nga maka Nnamdi Kanu - Garba Shehu
Eyinnaya Abaribe Onweghị ihe ndị DSS kwuru maka nwụchi Abaribe ruo ugbua Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola sị na Enyinnaya Abaribe bụ omeiwu na-anọchite anya Abịa Saụt n'Ụlọomeiwu Ukwu kwesịrị ịnọ na nga. Ka Ụlọomeiwu na-eme ọgbakọ ha nke Wenezde bụ ụbọchị nke 29 nke ọnwa Janụwarị, Abaribe sị na ọ bụrụ na Onyeisiala Buhari agaghị echekwanwu Naịjirịa, ya buru akpa ya laa. Gịnị ga-emezi Abaribe ma Kanu abịaghị ikpe ya taa? Nwụchị Abaribe: Ihe otu na-achọ Biafra kwuru maka ya 'A gaghị m etinye ọnụ n'okwu N100m ụlọikpe sị anyị kwụọ'-Abaribe Abaribe sị na o kwuru nke a makana o gosiri na Buhari agaghị achịtanwu Naịjirịa. Ọ sị na ihe tụrụ ya n'anya bụ na onyeisiala sị na oke ogbugbu mmadụ na-aga n'ihu na Naịjirịa na-atụ ya n'anya. Okwu ya abụghị ihe a nabatara nke ọma n'ogige gọọmentị. Shehu na onwe ya gbarụrụ ihu maka okwu Abaribe. O kwuru uche ya na Twitter sị na Abaribe enweghị ikike ikwu ụdịrị okwu a o kwuru, makana o so na pati ọ sị tinyere Naịjirịa n'ọnọdụ ọ nọ ugbua. Ọ gakwara n'ihu sị na Abaribe, dịka onye gbaara Nnamdi Kanu akaebe, nyere ya ohere iji gbanarị ikpe gọọmentị na-ekpe ya, kwesịrị ịnọ na mkpọrọ. Ọ sị na ọ bụrụ na Buhari ga-aritu n'ọkwa, ọtụtụ mmadụ gunyere Abaribe kwesikwuru iritu.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "National security", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51307386
Coronavirus aghọọla nnukwu nsogbu nye ahụike ọha na eze ụwa - WHO
WHO etiela mkpu ka mba ụwa kee nkwụcha dịka ọrịa Coronavirus na-efesa.
2020-01-30T08:46:11Z
WHO: Coronavirus egbuola mmadụ 170, jide mmadụ 7834
Ndị China WHO etiela mkpu si ka mba ụwa kee nkwucha dịka ọrịa Coronavirus ghọrọla nnukwu nsogbu nye ahụike ọha na eze mba ụwa nke Bekee kpọrọ " Public Health Emergency of International concern". WHO gbara ama na ya bụ ọrịa egbuola m mmadụ otu nari na iri asaa, ebe ya bụ ọrịa ji derela mmadụ. Coronavirus vs Lassa: Ihe ndị ajọ ọrịa abụọ a ji yie onwe ha Ihe gọọmentị Naịjirịa na-eme ịgbochi ọrịa Coronavirus Onye e che na o bu coronavirus bata n'Ivory Coast ebughi ya n'ezie - Ministri ahụike Tupu ị gaa China lekwa ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus N'ozi ha wepụtara n'abali Tọzde, WHO kwuru na ọtụtụ ndị ọrịa si mba China dịka ngụkọ gosiri na mmadụ 7736 nke pụtara mmpasent 99 ndị bu ya bụ na mba China. Ha kwuru na ihe gara aka njọ ma ọ bụrụ n'ọbụghị na mba China bidoro n'ehihie chọwa ewu ojii. Dọkịta Tedros Adhanom Ghebreyesus bụ onyeisi otu WHO Ihe ndị a nile pụtara ihe na mkparitaụka nke Dọkịta Tedros Adhanom Ghebreyesus bụ onyeisi otu WHO na ndị ntakụkọ nwere . "Aha a ga na-akpọgodị ọrịa coronavirus ọhụrụ a bụ "2019-nCoV acute respiratory disease" Orịa Coronavirus nke bidoro na China n'ọgw ụgwụ afọ 2019 abanyela na mba Japan, Vietnam nakwa Germany. Gịnị bụ isiokwu nzuko Buhari na Jonathan nwere? Onyeisiala Muhammdu Buhari lere onye bubụ Onyeisiala bụ Goodluck Jonathan ọbịa n'obi ọchịchị Aso Rock n'ụbọchị Tọzde. Ndị isi abụọ a nwere obere mkparịtaụka ime ụlọ bụ nke na-ewere ihe dịka nkeji iri. Ụbịam na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ọ bụ nwanne? Ihe Goodluck Jonathan kwuru maka Saraki Jonathan mgbe ọ pụtara agwaghi ndị ntaakụkọ okwu mana kepukepu kwuru si n'akwụkwọ Punch sị na ọ bịara ikele Buhari maka nkwado o nyere ya mgbe a wakporo ụlọ ya. Akụkọ kwukwara na Buhari kwere Jonathan nkwa na a ga-echekwa ya. Cheta na Jonathan bịakwara ụdị njem a n'ụbọchị 10 nke ọnwa Ọktoba, 2019. Bruno ọ ga-ebuputa Manchester United? Otu egwuregwu Manchester United azụọla Bruno Fernandes na-agbara Sporting Lisbon bọọlụ n'ebe etiti. Manchester United ji ọnụego dị nde paund iri anọ na asaa zụta Fernandes bụ onye ga-abara ha bọọlụ ruo afọ ise na ụma. Dịka ọ na-etinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta, Fernandes sị na ọ ga-agba mbọ ịhụ na ọ mabutere iko na Manchester United. Ọwụwanyanwụ ga-enwe ndị ọrụ nchekwa nke ha - Umahi Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa Gọvanọ Dave Umahi bụ onyeisi ọgbakọ gọvanọ ndị ọwụwa anywanwụ kwuru nke a n'Abakaliki n'ụbọchị Wenzde. O kwuru na ọ bụ iji chekwa ndị Igbo n'aka ndị ọchịehi Fulani na nsogbu ndị ọzọ n'ebe ndụ na akụnaụba ha dị. Onye na-achị Ebonyi amachiela ọchị ehi Nkata ọhụrụ ndị Gọvanọ ọwụwa-anyanwụ na-akpa maka nchekwa Ọ kpọpụta beghị aha ọbụla a ga-agụ otu ahụ mana a na-atụ anya na ọ ga-amalite n'oge adịghị anya. Buhari na ndị ọru nchekwa na-eme nzukọ n'Abuja Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọọla ndị isi ọrụ nchekwa niile nzukọ na-aga n'ihu n'Abuja ugbua. Nzukọ a bụ nke ndị akpọrọ "National Security Council Meeting" na-eme n'Obi Gọọmentị dị n'Abuja. Nke a na-abịa n'azụ ụfọdụ ndị omeiwu sị ka ndị isi ọrụ nchekwa rituo n'ọkwa maka oke ogbugbu mmadụ na-aga n'ihu na Naịjirịa. Otu onye n'ime ha bụ Enyinnaya Abaribe sị na Onyeisiala Buhari n'onwe ya kwesiri iritu. Lee ihe onyonyo si nzukọ a pụta ọnụ na-ekwuru Buhari na soshal midia bụ Bashir Ahmad wepụtara. Coronavirus ka na-akpọtụ taa Otu nwata akwụkwọ Naíjiría na-agụ mahadum na Chaịna agwala BBC Igbo ihe ha na-agabiga dịka ọrịa Coronavirus na-abawanye na mba ahụ Nwaokoroọbịa ahụ aha bụ Emmanuel si na ọ bụ kwa ụbọchị ka a na-enyocha ha ahụ ịmata ka ha enwere ịba. Ọ sị na nke ka njọ bụ na anaghi ekwesi ka mmadụ me ngaghari na-ejighi ikike nke mere na agụ bụzi ezigbote nsogbu ha nwere ugbu a. Nke a na-abịa dịka ekwuputala na nje Coronavirus abaala mpaghara Chaina niile ma gbuo mmadụ otu narị na iri asaa ebe mmadụ puku asaa na narị asaa bu ya na ya bụ mba. N'egwuregwu, Novaj Djokovic na Roger Federer na-asọmpị onye ga-agafe ruo agba nke ngwụcha na iko Australian Open Na asọmpị ụmụnwaanyị Garbine Muguruza mere Simona Halep iji ruo agba nke ngwụcha Abaribe ekwughi uche ụmụ Naịjirịa - Garba Shehu Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Graba Shehu asaala Enyinnaya Abaribe maka oku ọ kpọrọ ka Onyeisiala gbaa arụkwaghị m. Shehu kọwara na oku ahụ enweghi isi nakwa ọbụghị uche ụmụ Naịjirịa. Ebe Buhari Resign na-ewusike na Twitter dịka ndị mmadụ ji ya a kpọ oku ka Onyeisiala Muhammdu Buhari ritue n'ọkwa ọchịchị. N321m maka akwa mmiri Niger abụọ N'akụkọ yiri ya, gọọmentị Naịjirịa ahazichaala usoro a ga-esi weghachite nde naira narị atọ na iri abụọ na otu so n'ego Abacha zopuru Naịjirịa Ha kwuru na ego ahụ ka a ga-eji rụọ okporoụzo Lagos na Ibadan, nke Abuja na Kano nakwa Akwa mmiri Niger nke abụọ. Na mba ofesi, Mba Cote d'Ivoire ekutuola ugbua dịka a chọpụtara na onye e chere na o bụ Coronavirus ebughị ya bụ ọrịa. N'akwụkwọ ozi ha depụtara ha kwuru na nwata akwụkwọ ahụ si Pekin bata Abidjan alaala be ya. N'egwuregwu, Otu Manchester Utd azaala aha nna ha mgbe ha ji otu ọkpụ goolu merie otu Manchester City. N'agbanyeghị nke a, otu Mancity eruola agba ikpeazụ n'asọmpị iko EFL ebe ha ga-ezute Aston Villa. Gere akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ivory Coast", "Ebonyi Steeti", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51306628
'Anyị agaghị asa Garba Shehu, okwu a karịrị ya' - Ọnụ na-ekwuru Abaribe
Ọnụ na-ekwuchitere Sinetọ Abaribe ekwuola okwu maka ihe Garba Shehu kwuru maka ọkwa ọ mara ka onyeisiala bụ Muhammadu Buhari gbaa arụkwaghịm.
2020-01-30T10:42:09Z
Buhari Resign: 'Anyị agaghị asa Garba Shehu, okwu a karịrị ya' - Ọnụ na-ekwuru Abaribe
Onyeisiala Muhammadu Buhari na Omeiwu Enyinnaya Abaribe Ọnụ na-ekwuchitere Enyinnaya Abaribe bụ Uche Awom azaghachila okwu Garba Shehu kwuru maka ọkwa Abaribe mara ka Onyeisiala gbaa arụkwaghịm. Maazị Abaribe sị na ihe butere ya bụ ọkwa bụ maka etu nchekwa obodo Naijirịa siri kụọ afọ n'ala. Abaribe kwesiri ịnọ nga maka Nnamdi Kanu - Garba Shehu Ikike onye kwuo uche ya na-akawanye njo na Naijiria- Abaribe Kama, onyeisiala Buhari sitere n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Shehu zahachi ya, were sị - na ụfodụ ndị na-ekwu ka Buhari pụọ n'ọchịchị abụghị na ọ bụ uche ndị Naijirịa niile. Gụọ ihe o kwuru n'ụjụ ebe a. N'ịza ihe o kwuru, Awom sị "agaghị ewetu okwu a ala maka na o rughi Garba Shehu ọnụ". Garba Shehu sị na Abaribe kwesiri ịga nga Ọ kọwakwara na ọ bụ ihe Sinetọ Abaribe kwesịrị ime ka o mere dịka onyeisi ndị omeiwu na-anọghị n'ọchịchị. Ọ sị "ọrụ ya dịka onyeisi ndị anọghị n'ọchịchị bụ igosi gọọmenti ebe ha riri mperi." O kwuru na ihe kacha dị Abaribe mkpa bụ nchekwa ndụ na akụnaụba ndị Naijirịa niile. Ihe o kwuru dịka Shehu rụtụrụ okwu Nnamdị Kanu aka Awom sị na okwu Nnamdi Kanu bụ ihe dị n'ụlọikpe, "Shehu ekwesịghị itinye ọnụ n'okwu dị n'ụlọikpe". Dịka ụlọikpe kwuputara atụmatụ maka ụgwọ mgbapụta Kanu, Awom kwuru na Abaribe mere ihe o kwesiri ime dịka onye Igbo. Nnamdi Kanu: Abaribe na Fani-Kayode ga-agwa anyị ka o si gbapụ na Naịjirịa - Ọkaiwu Gịnị ga-emezi Abaribe ma Kanu abịaghị ikpe ya taa? O kwukwara sị na ha agaghị ekwu maka okwu Kanu n'ihu Shehu maka na Shehu abụghị ụlọikpe. Ọ bụghị taa ka Abaribe bidoro ikwu maka ihe ndị Naịjirịa na-agabiga, ọkachasị ebe o metụtara nchekwa, dịka na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe a: Ọtụtụ ndị mmadụ kwuputara obi ha maka ọkwa a mara ka onyeisiala gbaa arụkwaghịm, lee uche ha: Tosin Olugbenga chetara ihe gọọmentị Buhari kwuru mgbe ha banyere n'ọchịchị. Leesi Barivole sị "Dịka anyị kwadoro #justiceForChima, ka anyị kwadokwa #BuhariResign". Adeparusi Adebayo sị "ọzọ e bo Abaribe ebubo nrụrụaka". Baba Alhaji sị na Abaribe kwesịrị ịnọ na nga. Akụkọ ga-amasị gị Onye e che na o bu coronavirus bata n'Ivory Coast ebughi ya n'ezie - Ministri ahụike Abaribe kwesiri ịnọ nga maka Nnamdi Kanu - Garba Shehu Amaghị m ma e gbuola ndị omekome gburu di na nwunye n'Umuahia - Abia PPRO Otu onye ọzọ eburula ọrịa Lassa Fever n'Enugwu
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45322732
Iri ji ọhụrụ n'Alaigbo
Lee uru emume ji ọhụrụ bara n'Alaigbo: Isu-Ava ndị Uburu Adu.
2020-01-31T10:41:45Z
BBC gbaara ndị Uburu Ohaozara akaebe mgbe ha riri ji ọhụrụ
Uburu Ebonyi steeti Iri ji ọhụrụ n'Adu Uburu Ji bụ eze nri niile di n'ụwa, dịka Ndigbo siri kwekọrịta. Ya kpatara e jiri wepụtara ya ụbochị pụrụ iche. N'obodo ụfọdụ n'Alaigbo, ụbọchị e ji eri ji ọhụrụ bụ mbido afọ ọhụrụ ha. Otu a ka ọ dị n'Uburu Adu nke dị n'okpuru ọchịchị Ohozara n'Ebonyi steeti. Uru nzu bara n'ala Igbo Emume maka mbili n'ọnwụ kraịst Ala Igbo: Ka emume Ista siri gaa Emume ji ọhụrụ nwere ọtụtụ aha n'Alaigbo. Ndị Uburu n'onwe ha na-akpọ ya 'iri ji ọvụ' nke pụtara 'iri ji ọhụrụ' maọbụ 'Isu Ava'. Ndị ọzo n'akpọ ya ikeji, iri ji ọhụrụ, ịhajiọkụ, iwa ji na ọtụtụ aha ndị ọzo dị iche iche. A na-eme emume iri ji n'Alaigbo kwa afọ site n'ọgọst ruo ọnwa septemba. Oge a bụ mgbe eji egwuputa ji ọhụrụ n'ala. Ji ohuru Ọ bụkwa ọge a ka eji akwusịlata ịgwupụta akụkụ n'ụgbọ n'Alaigbo bụrụ malite ọrụ ụgbọ ọzọ. Ejikwa mgbe dị otụ a ezurukwa ike ọrụ n'Alaigbo tụpụ amalịta ọrụ ọzọ. Onweghị onye ma ka ya bụ emụme siri bido n'Alaigbo, mana ihe anyị chọpụtara bụ na iri ji nwere ugwu pụrụ iche ndị Igbo n'akwaghere ya. Emụme na nganga sọ iri ji n'Alaigbo kariri akari nke bụ na ọtụtụ mmadụ na-esi obodo dị iche iche lọtacha obodo ị bịa mee emume iri ji. Ndị enyị, ọgọ na ikwu na ibe na-abịa sọrọ irie ma ṅụkwa. Iri ji ohuru na Adu Uburu Nke ndị Uburu Ado mere mgbe ọnwa ọgọst dị mkpụrụ ụbọchị iri abụọ n'afọ a gọvanọ Dave Ụmahị na oriaku ya bịara ebe ahụ, iji gosi ka ya bụ emụme si dị mkpa. Gọv. Dave Umahi na ọrịakụ na Isu Ava Uburu N'otu aka ahụ, ndị Igbo niile nọ n'ofesi na-emekwa emụme iri ji. N'obodo ụfọdụ n'Alaigbo ọ bụ Eze obodo maọbụ Ezemụọ na-aka mgbe eji eri ji n'ime onwa ọgọst rue septemba. Iri ji ohuru n'Adu Uburu Onye kọọrọ BBC ka esi mee emume iri ji nke afọ a n'ụbụrụ bụ Ojukwu Innocent Ene sịrị n'ụburu, ọ bụ onye ọgụ ava (onye na-agụ afọ) na-aka mgbe oge iri ji ohụrụ ruru. Ọ bụ naanị ndị Ọgwụnta nke dị n'ime Uburu ka ọ bụ ọrụ ha ịgụ ya bụ ava (afọ). "Ya bụ Ezemou na-eji ohere a kele Chukwu Abịama maka uju nri akọpụtara n'afọ ahụ, ọ kachasị ji" , dịka Ene siri kwuo. Ọ kwụkwara na "n'Alaigbo, ji bụ eze nri. Ya kpatara ojiri bụrụ arụ mmadụ itukwu n'elu ji" agbanyeghị ka ugwu ejina onye ahụ. Ji ochie Ihe ndọhachị azụ dị n'emụme a bụ na ndị ọgbaraọhụrụ na-ahụtazị ememe iri ji dịka emụme arụsi. Mana Ene kwuru na n'ezie emume iri ji enweghị ihe gbasara ya na arụsị. "Ọ bụ emụme eji ekele Chineke maka ji ọhụrụ nakwa afọ ọhụrụ, ma ị kọtara ya ma ị gotere n'ahịa". Ọ bụrụ na ekelecha orisaebuluwa maka onyinye a, onye ọbụla amalite iri ji. Igwe Akpandu nke Uburu na-ekpe ekpere maka ji ọhụrụ Gịnị mere ji jiri bụrụ eze nri niile n'Alaigbo? Ji bụ eze nrị nịịle maka onweghị ihe dị na ji na-alaniyi. Esi ọtụtụ ụzọ eri ji. A na-esu ya na mmanụ. Gọv. Dave Umahi na-eri ji mbụ n'afọ A na-ete ya ete, sụkwa ya ka nri onuno. Eji ji eme ụrị n'ofe nke ga-eme ka ofe rọọ arọ. Isu ụtara ji Ya mere eji echị onye kachasị akọ ji na mba echịchị pụrụ iche. N'Ụbụrụ Adọ nakwa ebe ndị ọzọ, a na-etụ onye ahụ Osuji. Onwekwara ndị na-echị onye ahụ Di ji maọbụ Ezeji. N'Ikem, onye kọtara ji gbara mkpị abụọ maọbụ ji ogene dịka ha na-akpọ ya, a na-etu onye ahụ Ezeji. Dịka Ojukwu Ene siri gụpụtara anyị, ihe ndị a bụ ụrụ iri ji baara ndị Igbo. Uru emume iri ji baara ndị Igbo Emụme iri ji na-eweta ohere maka mmekọ mmadu na ibe ya nakwa ndị nna nna anyị. Ọ bụ mgbe dị otụ a ka eji eme udo n'obodo dị iche iche n'Alaigbo. A na-ejikwa mgbe di otu a enykọrịta onyinye dị iche iche nke na-egosi ihunanya. Mgbe ahụ ka eji ekele Chineke maka ihe ọma omeere anyị site na-inye anyị nrị, ahụike, ihe akụakụ n'ihe enwenwe. O gosiri mmekọ na ịdị n'otu. Iri ji so n'isi omenala Igbo. N'abalị ụbọchị a ga-eme emume iri ji, a na-ericha ji ochie nịịle iji nabata ji ọhụrụ. Gọv. Dave Umahi na Oriakụ n'emụme iri ji ndị Uburu Mgbe ahụ ji n'amalitekwa imebi, iji gosi na oge ya agaala. N'ụbụrụ Ado, dika na ebe ndị ọzọ, a na-eji emume dị iche iche anabata ji ọhụrụ. Ọ bụrụ na a gọcha ọfọ ya na ya sọ, nke onye Eze, ma ọ bụ Ezemụọ ga-eme, onye ọbụla amalite iri ji ọhụrụ. Onye ọbụna gọrọ ya bụ ọfọ ga eji mmanu nri erie ya bụ ji ohuru ahụ tupu ndị ọzọ amalite. Ụmụokorobịa bịara iri ji n'Uburu Ezinaụlọ ọbụla ga-eji ihe ha nwere rie ji ọhụrụ. Ụfọdụ na eji ọkụkọ, ebe ndị ọzọ na eji ewu. Ebe aka uru nwaanyị otukwasa dị ya. Akụkọ ga-amasị gị Trump o kwuru na Buhari adịghị ndụ? Ndị omekome emerụọla ala n'Imo steetii Ndụmọdụ 11 maka ndị chọrọ ịga ala bekee ga biri
[ "Naijiria", "Omenala", "Ebonyi Steeti", "Ọrụ ugbo", "West Africa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51307395
Ụlọọrụ onyeisiala egbochiela onye ọrụ ụlọikpe inye ha akwụkwọ akpọmoku maka ikpe Hanan Buhari
Ụlọọrụ nnọchite anya mba Amerịka akọwaala na ọ bụ akụkọ ụgha na ha jụrụ inye Bishop Oyedepo visa.
2020-01-31T21:07:03Z
Hanan Buhari's Sim card: Ụlọọrụ onyeisiala gbochiri onye ọrụ ụlọikpe inye ha akwụkwọ ụlọikpe- Ọkaiwu
Hana Buhari E jichiri Anthony Okolie izuụka iri maka inwe 'sim card' bụbu nke Hanan Buhari, nwa onyeisiala I chetara akụkọ maka Anthony Okolie bụ onye ndị uweojii nzuzo kpọchiri izụụka iri maka ịzụ ma nweghara 'sim card' bụbụ nke nwa onyeisiala Muhammadu Buhari aha ya bụ Hanan Buhari? Akụkọ pụtara taa na-ekwu na onyeọrụ ụlọikpe ukwu dị n'Abuja gara iweghara Hanan Buhari akwụkwọ ikpọ oku mana ndị ọrụ onyeisiala enyeghị ya ohere. Anthony Okolie,bụ nwa amadi ahụ a tụnyere na mkpọrọ ndị DSS abalị gbara Hanan, DSS na ụlọọrụ MTN akwụkwọ n'ụlọikpe ma na-ekwu ka ha kwụọ ya nde narị naira ise maka ijichi ya. E jichiri Anthony Okolie izuụka iri maka inwe 'sim card' bụbu nke Hanan Buhari, nwa onyeisiala Ọkaiwu Okolie bụ Tope Akinyode gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo n'ekwenti na ha gbara akwụkwọ n'ụlọikpe n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Jenuwarị afọ 2020 ka ndị ometụtara kwụọ ụgwọ megide e begidere onye ọ na-ekwuru. "Mana oge onye ụlọikpe gara inye ha akwụkwọ, ha jụrụ ịnabata ya." Ha kwuru na ha amaghị onye bụ Hana Buhari. Na onye bi n'obi ụlọrụ gọọment bụ Muhammadu Buhari." Akinyode kwuru na ka o si na dị,na ha ga-alachi n'ụlọikpe rịọ ụlọikpe ohere isi ụzọ ọzọ chụwa ihe dị ha mkpa. Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bashir Ahmad amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zaghị ozi e zigara ya na soshal midia oge akụkọ na-apụta.. Asị asị ooo!!! O nweghi mgbe anyị jiri jụ inye Oyedepo visa Amerịka Ụlọọrụ ndị na-enye akwụkwọ ikikere ịbata obodo n'Amerịka ekwuola n'igwe Twitter na o nweghi mgbe ha hapụrụ inye Bishop Oyedepo ikikere ịbata obodo. O nweghi mgbe anyị jiri hapụ inye onyeisi ụka Winner's Chapel visa. Ndị Ọkada na mere ngagharị iwe na Legọs taa Ndị ọkada emela ngagharị iwe maka mmachi gọọmenti Legọs sị na ha ga-ebido echi machiwe ha ịgba n'okporoụzọ Legọs. Ha gwara ndị ntaakụkọ dị n'ebe a na-eme ngagharị iwe ha mmachi a ga-eme ka ụfọ ndị a bazie omekome. Coronavirus eruola UK Akụkọ na-akọwa na mmadụ abụọ ebutela ọrịa Coronavirus. Ndị ọrụ ahụike kwuru na mmadụ abụọ ahụ si n'otu ezinaụlọ mana ha ekwuputebeghị aha ha. Ihe gọọmentị Naịjirịa na-eme ịgbochi ọrịa Coronavirus Coronavirus vs Lassa: Ihe ndị ajọ ọrịa abụọ a ji yie onwe ha "Oteela aka anyị na-akwado maka ọrịa nke pụtara na anyị dị njikere ịlụso ya ọgụ" ka Chris Witty kwuru. Nke a ga-eme ya mba iri na itoolu ebe ọrịa ahụ ferela kemgbe ọ malitere na mba Chaịna. Otu PDP emela ngagharịiwe n'Abuja Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-akọwa na ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'otu PDP gụnbyere Sịnetọ Enyinnaya Abaraibe na-eme ngagharị iwe n'Abuja maka ọnọdụ ala Naịjirịa Ha kwuru na ebe ndị ha ga-emetu gụnyere isiụlọọrụ mba Briten, nke mba Amerịka nakwa kọmishọn Yurop. Ndị na-efe ala nna ha eriwela N33,000 ugbua Ọ dị ka emegharịrị ekeresimesi ọzọ Ndị na-efe ala nna ha na-amali elu na-enwe aṅụrị na soshal midia dịka amalitere ịkwụ ha naịra puku iri atọ na-atọ ka ụgwọ ọnwa. Onye dịka Joshua gosiri etu o si aṅụrị nke ya Cheta na ọ bụ abalị ole na ole gara aga ka gọọmentị etiti kwere ha nkwa ịbulite ụgwọ ọnwa ha. Ọ nụrụ kara ibe ya - WHO Ngalaba WHO na-elekọta ahụike na mba ụwa niile etiela mkpu maka Coronavirus na-agwa ma oke ma nta ha kee nkwụcha n'ebe ọrịa a nọ. Mkpebi a bịara dịka ha mechara nzụkọ imeụlọ n'ụbọchị tọzde iji mata ụdịrị mkpamkpa ọrịa a na-akpa. Ọzọ, Ndị uweojii na Taraba steeti anwụchiela otu nwoke gburu enyi ya nwaanyị na steeti ahụ. Munda Bala kọwara na ya na enyi ya abụọ jikọrọ aka gbuo enyi ya nwaanyị n'ihi anya ụfụ na oke ihe isike dị n'obodo. N'egwuregwu, Ọgbaa bọọlụ Naịjirịa bụ Bright Enobhakare adịla nkwadobe ịhapụ otu ya bụ Wolverhampton Wanderers sonye ndị Birmingham City. Mana ka ọ dị ugbua, ekwubeghi ego ole a ga-eji zụrụ ya. Gere akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ahụike", "World Health Organization (WHO)" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51343690
Manchester United na Wolves bụ nnọọ ezigbo di na nwunye
Onweghị otu meriri ibe ya mgbe Manchester United na Wolves zutere onwe ha ụbọchị Satọdee.
2020-02-01T19:56:47Z
Manchester United vs Wolves: Otu abụọ a bụ nnọọ ezigbo di na nwunye
Man Utd na Wolves Otu egwuregwu bọọlụ Manchester United na Wolves dịzi ka ha abụ di na nwunye n'eziokwu. Ha abụọ eneyghị goolu ọbụla oge ha zutere n'ọgbọ egwuregwu 'Old Trafford' n'uhuruchi Satọdee. Wolves agwọọla Man Utd ara Man Utd na Wolves ekpeela udo n’alụmdinanwunye ha Ihe mere Man Utd na Wolves ji dị ka Ejima Bruno Fernandez Man Utd zụrụ oke ọnụ azọpụtaghị ha Tupu egwuregwu nke taa ha abụọ nwere akara 34. Ka egwuregwu taa gwụrụ, ha abụọ nwere akara 35. Naanị goolu anọ ka Man Utd ji kara Wolves na tebulu EPL. Man Utd bụ ndị nke isii ebe Wolves bụ ndị nke asaa na EPL ugbua. Oge otu abụọ a zutere n'ọnwa Ọgọst 2019, ha gbara 1-1. Mgbe ha zutere n'asọmpi FA n'abalị anọ nke ọnwa Janụwarị 2020, ha gbara 0-0. Man Utd jisi ike merie Wolves 1-0 mgbe ha zutere ọzọ n'iko FA n'abalị 15 nke ọnwa Janụwarị. Asọmpi nke taa bikwara 0-0. A ga-akpọzị ụkọchukwu ka ọ gbaa otu abụọ akwụkwọ? Ọ bụrụ na Tottenham emerie Manchester City ụbọchị ụka, ha ga-awufere ma Manchester United ma Wolves. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: 'Onweghị onye bu ọrịa coronavirus na Legọs' Abaribe, ọnwụ Kobe Bryant na ihe ndị ọzọ mere izu a ji bụrụ 'a takata a gbọọ' A na-asọ ụmụnwaanyị nọ na nsọ ha asọ? Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Egwuruegwu", "Manchester United", "Bọọlụ", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51346149
Adeboye na ụka RCCG na-aga njem ekpere maka nchekwa
Onyeisi ụka Redeemed Pastor Adeboye du ndị ụka na-eme ngagharịiwe maka ọnọdụ nchekwa.
2020-02-02T07:11:20Z
RCCG Prayer Walk: Adeboye na ụka RCCG na-eme ngagharịiwe maka nchekwa
Onyeisi ụka Redeemed Onyeisi ụka 'Redeemed Christain Church of God' bụ Enoch Adeboye du ndị ụka na-eme ngaghariwe na Naịjirịa niile maka ọnọdụ nchekwa. Ọ sị ka ndị otu soro na njem ekpere nke ndị jikọtara ụka Kraịst bụ CAN n'ịchafụ hiwere n'ihi ogbugbu a na-egbu ndị otu ha na Naịjirịa. Ngagharịiwe ndị Katọlik: Ka o si ga Kpeerenu Nigeria ekpere ma buoro ya ọnụ - CAN Osote onyeisi ụka a bụ Funso Odesola sị na parishi dị 25000 na Naịjirịa ga-eso mee ya bụ ngagharịiwe. Ngagharịiwe a na-abịa dịka onyeisi ụka Katọlik na Naịjirịa bụ Bishọp Hassan Mathew Kukah kwupụtara ogbugbu otu nwata akwụkwọ Semịnarị. Nwata a bụ Michael Nnadi, onye gbara afọ iri na asatọ so n'ụmụakwụkwọ anọ a tọọrọ na Kaduna n'ọnwa Jenụwarị afọ 2020. E mechara gbuo ya na otu nwaanyị ma tọhapụ ụmụakwụkwọ atọ ndị ọzọ. Cheta na ndị ụka Katọlik mekwara ngagharịiwe maka ogbugbu ndị ụkọchukwu ha n'ọnwa Mee afọ 2018, Ọtụtụ ndị mmadụ na-abatara atụmatụ a nke ha gosiri na soshal midia; Anwụchiela onye chọrọ ịtụ ogbunigwe n'ụlọụka 'Winners Chapel' Ụkọchukwu David Oyedepo bụ onyeisi ụlọụka 'Winners Chapel' Aka ndị uweojii akparala otu onye chọrọ ịtụ ogbunigwe n'ụlọụka na Kaduna n'ụbọchị Sọnde. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kaduna gwara BBC na aha nwoke ahụ bụ Nathaniel Samuel. O kwuru na amatabeghị ma nwoke ahụ ọ bụ onye ụka 'Winners Chapel' ka o si esi bịa. Mana nnyocha ka na-aga n'ihu iji chọpụtachaa etu ya bụ ihe si mee. Taa bụ otu afọ Osinbajo nyara ihe mberede ụgbọelu Ụgbọelu helịcọpta Osinbajo nọ n'ime ya dara n'afọ 2019 mana o nweghị onye nwụrụ Ụgbọelu a ị hụrụ ebe a bụ nke osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo sị na ya ripụta otu afọ gara aga mgbe ọ dara kụjaa na Kabba. Osinbajo na-aga njem ịchụ nta vootu na Kogi mgbe ya bụ ihe mberede mere. Ọ tụụrụ Chineke mmamma maka ịme ka ya na ndị otu ya bụrụ ndị dị ndụ n'ala ndị dị ndụ taa. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ezitere Osinbajo ozi iji soro ya kelee Chineke maka ịzọpụta ya na ndị ọrụ ya n'ihe mberede ahụ gaara ịta isi ha. Ọkụ gbara ụlọọrụ Inec n'Anambra steeti Ka o ji ọkara gafee elekere iri na abụọ nke ehihie ụbọchị Sọnde, ọkụ malitere ịgba ụlọọrụ ndị Independent National Electoral Commission (Inec) nke dị na Ogidi n'ime okpuruọchịchị Idemili Nọt dị n'Anambra steeti. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed mere ka anyị mata na ya bụ ọkụ malitere n'ọhịa dị n'akụkụ ụlọ ahụ were bata. Ebe ndị ọrụọkụ gbaliri ike ha ịgbanyụ ya bụ ọkụ, ndị uweojii egbochiela ogige ahụ maka ndị ohi na ndị ekperima dịka ha na-etinye anya n'ihe kpatara ya bụ ọkụ. BBC gbaliri inwete onyeisioche Inec n'Anambra bụ Nkwa Orji, mana ọ zaghị ekwenti ya. Igwurube na-enye nsogbu n'Ọwụwa anyanwụ Afrịka Igwurube na-atakasị ihe a kụrụ n'ubi na Somalia Nnụ kwuru nnụ igwurube na-eyi ndị mmadụ egwu ugbua na mba dị icheiche na mpaghara ọwụwa anyanwụ Afrịka site n'ịtakasị ihe ha kọrọ n'ubi. Mba ebe igwurube ndị a na-akpa ike gunyere Somalịa, Ethiopia na Kenya, mana ọ bụ na Somalia ka ọ ka njọ. Otu mba ụwa bụ UN kwuru na igwurube a ga-enye mba 20 nsogbu. Djokovic emeriela Novak Djokovic na Dominic Thiem Novak Djokovic emeriela Dominic Thiem iji turu ugo n'asọmpi tennis Australian Open nke afọ 2020. Mmeri a mere ka Djokovic gbagote n'ọkwa onye nke mbụ na ụmụnwoke na-akụ tennis n'ụwa niile. Nke a bụkwa nke ugboro asatọ Djokovic na-eturu ugo n'asọmpi a. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji Naịjirịa ọ dị njikere maka coronavirus? Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa kwuru na ha enwetela ngwaọrụ eji enyocha ahụ maka ọrịa coronavirus. Ha sị ka onye ọbụla si mba Chaịna bata n'ime otu ọnwa gara aga gbalịa chịkọta onwe ya ruo izuụka abụọ ma kpọtụrụ ndị ọrụ ahụike. Ozi a si n'akara twitter ha pụta kwuru na otu 'World Health Organisation' nyere ha aka nwete ngwaọrụ ndị ahụ. N'aka ọzọ Coronavirus egbuola otu nwoke gbara afọ iri anọ na anọ na mba Philippines dịka ọ bụ onye mbụ ọrịa a gburula na mba ọzọ na-abụghị Chaịna. N'agbanyeghi na nwoke a bụ onye Chaịna, a sị na ọ dịka o bu ọrịa a si Chaịna bata zie na Philippines bụ ebe ọ nwụrụ. Coronavirus vs Lassa: Ihe ndị ajọ ọrịa abụọ a ji yie onwe ha Coronavirus aghọọla nnukwu nsogbu nye ahụike ọha na eze ụwa - WHO Tupu ị gaa China lekwa ihe ị kwesịrị ịma maka ọrịa coronavirus A sị na oke oyi (pneumonia) malitere tụwa nwoke a mgbe ebugachara ya n'ụlọọgwụ na Manila bụ isi obodo Phillippines. Ihe karịrị mmadụ narị atọ anwụọla n'ọrịa a kamgbe ọ pụtara ebe ibu ya akarịala puku iri na anọ n'ụwa niile. Mana ndị ọ ka metụta bụ ndị si na Wuhan dị na mpaghaara Hubei nke Chaịna. Nwaanyị ọzọ ya na nwoke so si mba Chaịna bata Philippines bukwa ọrịa a mana ọ ka dị ndụ. Ndị dọkịta etiela mkpu maka ọrịa Lassa Fever Ndị dọkịnta na Naịjirịa agwala gọọmentị etiti busie agha ike megide ọrịa Lassa fever dịka ọrịa na-egbu onye ọ na-arịa nakwa onye na-agwọ ya. Dịka ọ dị ugbua ọrịa a eguola ihe ruru mmadụ iri anọ na otu na Naịjirịa nke gụnyere ndị ọrụ ahụike. Akwụm chịm na PDP - Nwosu Onye na-anọchiteanya ndị Ezinihitte n'ụlọomeiwu Imo Steeti bụ Anyadike Nwosu ekwuola na kwụchịm n'otu PDP iji katọọ akụkọ sị na ọ mabala n'APC. N'ozi o wepụtara, Nwosu sị na o nweghi ebumnobi ọbụla ịbanye Pati APC. N'egwuregwu Onye nchịkọta otu egwu Manchester City bụ Pep Guardiola sị na ahụta ya dịka onye mara afọ n'ala maọbụrụ na ọ mabuteghi Iko Champions League. Agbanyeghi na Guardiola ebutela Iko ise kamgbe afọ anọ ọ bịara Man. City mana ọ sibeghi Iko asọmpi Uefa ọbụla n'imi. Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Manchester City", "China", "National security", "Bọọlụ", "Ahụike", "World Health Organization (WHO)", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51350144
"Donatus Nwamkpa erubeghị ogo anyị ịsa ya okwu" - Ọnyeozi Abaribe
Uchenna Awom bụ ọnụ na-ekwuru Enyinnaya Abaribe asaala Donatus Nwamkpa bụ onyeisi otu APC n'Abia steeti.
2020-02-02T16:36:38Z
"Donatus Nwamkpa erubeghị ogo anyị ịsa ya okwu" - Ọnyeozi Abaribe
Eyinnaya Abaribe Onweghị ihe ndị DSS kwuru maka nwụchị Abaribe ruo ugbua Ọnụ na-ekwuru Enyinnaya Abariba bụ Uchenna Awom asaala Donatus Nwamkpa bụ onyeisioche otu All Progressives Congress (APC) n'Abia steeti okwu ọ gwara onyeisi ya. Uchenna sị na Donatus erughi onye ha ga-asa okwu maka na ya na Abaribe ahaghị. 'Anyị agaghị asa Garba Shehu, okwu a karịrị ya' - Ọnụ na-ekwuru Abaribe Abaribe: Ihe DSS jiri kpọchịe m Ikike onye kwuo uche ya na-akawanye njo na Naijiria- Abaribe Uchenna sị na "okwu Abaribe kwuru kemgbe abịlị olemole gara aga ka Nwamkpa tetere ura taa bia ikwu." O kwukwara na Abaribe kwuru okwu dị ka onyeisi pati nke nta n'ụlọemeiwu nke Bekee kpọrọ Minority Leader; na o rughiri Abaribe na Nwamkpa ịsakọrịta okwu. Akwụkwọ akụkọ Vanguard buru na Onyeisioche pati APC n'Abia Steeti bụ Donatus Nwamkpa gbara omeiwu Enyinnaya Abaribe ụkwụ n'ihi oku ọ kpọrọ ka onyeisiala Muhammadu Buhari rituo n'ọchịchị. Nwamkpa kwuru na ọ bụ Abaribe kwesịrị iritu n'oche Sịnetọ n'ihi na onwebeghi ihe a na-ahụ anya o mepụtara kamgbe afọ iri na atọ ọ bụụrụ onye omeiwu. O kwuru nke a na nzahachi okwu Sinetọ Abaribe kwuru n'ọgbọ ụlọomeiwu n'izu gara aga bụ ebe ọ kpọrọ oku ka onyeisiala Muhammadu Buhari rituo n'ọchịchị maka amaghị eme gọọmenti ya ọkachasị na nchekwa obodo. Nwamkpa bụ onye gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Isochi dị n'Umunneochi nke Abia steeti kpọrọ Abaribe oku ka ọ depụta ihe ọ rụpụtaara ndị ọ na-anọchi anya ha kemgbe ọ malitere ọchịchị afọ iri na atọ gara aga. Ekwenti Nwamkpa agaghị aga ịmata ma ya bụ okwu esi na n'ọnụ ya n'ezie. Akụkọ ga-amasị gị Adeboye na ụka RCCG na-aga njem ekpere maka nchekwa Etu mmadụ 20 si nwụọ ebe a na-azọ otite mmanụ nsọ 'Onweghị onye bu ọrịa coronavirus na Legọs'
[ "Naijiria", "Abia Steeti", "Ndọrọndọrọ ọchịchị" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-51350146
Tottenham agbaala Manchester City ose n'anya
Tottenham Hotspur ejirila ọkpụ goolu abụọ nyụọ Manchester City ịkpakwu.
2020-02-02T18:51:46Z
Tottenham vs Manchester City: Tottenham agbaala Manchester City ose n'anya
Oleksandr Zinchenko eriela arịrị Asọmpi otu egwu bọọlụ Tottenham Hotspur na Manchester City bụ nke kpọtụrụ na mgbede a n'egwuruegwu Premịa Lig. Tottenham Hotspur ji ọkpụ goolu abụọ merie Manchester City. N'eziokwu, Manchester City agbanyeghị na ha nọ n'obi ndị Tottenham site ka ha sị gbaa ha bọọlụ. Tottenham apịawaala Manchester City azụ Ihe Manchester City na Chelsea gbara Tottenham emeriela Rochadale Na nkeji nke iri atọ na itoolu ka ndị Manchester City newtara penariti mana Ilkay Gundogan tara ya. Tottenham ezughi ike n'agba nke mbu ebe Manchester City chị ọkụ sodo ha ma gbata akwụkwọ ịdọ aka na nti atọ ebe Tottenham ji otu tupu ha alaa ezumike. Ka abatachara ezumike ka enyechere Olexandr Zinchenko mpempe akwụkwọ mmeemmee na nkeji 60". Obi tọrọ onye nkuzi Tottenham bụ Jose Mourinho ụtọ nke ukwu maka mmeri ha. Steven Bergwijn nke Tottenham ji otu ọkpụ zaa aha ya na nkeji 63 iji kasie Mourinho obi. Ọ dị ka nke ahụ ezughị, Son Heung-Min nwaafọ Saụt Koria tinyere Tottenham goolu nke abụọ na nkeji 71. Mmeri a mere ka ndị Hotspur gbagolite na ogogo nke ise ebe Manchester City ka gwunyere na ogogo nke abụọ ha nọbu. Ọnwụ Manchester City na-esi ịnapụ Liverpool ndị nke mbụ na Lig kpuru afọ n'ala n'izu a ebe Liverpool ka jicha ihe ruru akara 22 aga ha. Akụkọ ga-amasị gị: "Donatus Nwamkpa erubeghị ogo anyị ịsa ya okwu" - Ọnyeozi Abaribe Adeboye na ụka RCCG na-aga njem ekpere maka nchekwa 'Onweghị onye bu ọrịa coronavirus na Legọs' Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Egwuruegwu", "Manchester City", "Premier League", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51354209
'Ọ bụrụ na Naịjiria dị mma echeghi m na a ga-enwe IPOB' - Fr. Ebube Mmụọnsọ
Ụkọchukwu ndị ụka Katọlik a ma dịka Fada Ebube Mmụọnsọ, gwara BBC Igbo ihe o che maka ikpe Hope Uzodinma na ọnọdụ Naịjirịa ugbua.
2020-02-03T11:12:47Z
Rev Emmanuel Obimma kwuru na ọ ma na 'wayo' ga-abanye n'ikpe Hope Uzodinma
Rev. Fr. Emmanuel Obimma a ma dịka Ebube Mmụọnsọ kwuru obi ya maka ọnọdụ Naịjiria nọ n'ime ya ugbua. Fada Obimma nke Holy Ghost Adoration Mịnịstrị dị n'Anambara steeti, kwuru na o cheghi na okwu gbasara IPOB gaara apụta ihe ma ọ bụrụ na ọnọdụ Naịjirịa dị mma. 'N'ikpeazụ, ụlọụka Katọlik nwereike ịmachi 'Adoration Ministry' Fada Mbaka' Amụma e buru na 2019: Ndị mezuru na ndị gbara ụka Ọchịchi Buhari dị mma - Mbaka O kwukwara sị na "anaghị ere amụma ere. Ọnụ ụkọchukwu na-ebu amụma", ka a jụrụ ya ihe o chere banyere amụma Fada Ejike Mbaka buru n'isi Hope Uzodinma bụ Gọvanọ Imo steeti. N'etu ikpe ahụ si dapụta, Fada Obimma kwukwara sị na ọ ma na "aghụghọ ga-abanye n'ime mkpebi ikpe ahụ". Lee ihe nkiri a ka ị chọpụta ihe ndị ọzọ o kwuru. Akụkọ a ga-amasị gị: Ihe isii ị maghị maka Arthur Nwankwo China arụọla ụlọọgwụ ọhụrụ n'ime otu izu Adeboye na ụka RCCG na-aga njem ekpere maka nchekwa
[ "Naijiria", "Ụka ndị Roman", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51368120
A gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị - Emeka Ihedioha
Emeka ihedioha kọwara ihe mere o ji sị ka ụlọikpe kachasị lebagharịa anya n’ikpe dị n'etiti ya na Hope Uzodinma.
2020-02-04T07:08:45Z
Imo State: A gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị - Emeka Ihedioha
Emeka Ihedioha ụlọikpe chụpụrụ n'oche gọvanọ Imo steeti, gwara BBC Igbo na mgbe e kpechara ikpe a na ọ nabataghị ya, mana o nweghi ihe ọ ga-emenwu maka na ọ bụ ụlọikpe kachasị kpere ya bụ ikpe. Kama na ya na ndị ọkaiwu ya nyochara ikpe ahụ ma chọpụta na o dị ka o nwere ohere ịlaghachị ka ndị ọkaikpe lebagharịa anya n'ikpe ha kpere. Amụma Mbaka emezuela, Hope Uzodinma emeriela dịka Gọvanọ Imo steeti Imo governorship Judgement : Ihe ise ụlọikpe Kachasị kọwara mere ha ji nye Hope Uzodinma mmeri Nke a bụ maka na ebe ha gbakwasịrị ụkwụ kpee ikpe a nwere ihe na-edoghi anya n'ime ya. O kwukwara na mgbe e mere ntuliaka ma kpọpụta ya dịka onye meriri, na o nweghi mgbe e kwuru na o nwere ọdọ ebe a na-atụ vootu dị 388 ha jiri tụkwasị n'elu vootu Hope Uzodinma. Mgbe a jụrụ ya maka ngagharịiwe ndị PDP na-eme maka ikpe a, Ihedioha sị na ọ bụghị ya gwara ndị PDP mee ngagharịiwe. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ndị PDP mere ngagharịiwe, kama na ndị mmadụ maara na ikpe e kpere ezighi ezi. N'ajụjụ ihe mere o ji dịka o ji aka ike achụ Rochas Okorocha bụ onye ọ natara ọchịchị, o kwuru na ihe o mere bụ ihibe kọmitii ga-ahụ maka iweghachịta akụnaụba ndị Imo Steeti a kpachiri akpachi. Na ihe o mere bụ ihe ndị Imo Steeti chọrọ n'aka ya, na ọ dịghị mma otu onye ikpachikọ akụnaụba gọọmentị bụ nke ọha nwe. Ihedioha gara n'ihu kọwapụta ọtụtụ ihe ndị ọ rụpụtara n'Imo Steeti n'ime ọnwa asaa ọ nọrọ n'ọchịchị. Mana mgbe BBC Igbo gbara Okorocha ajụjụ banyere etu Ihedioha si akpaso ya agwa, ọ sị na ọ bụghi akụnaụba Imo Steeti mere ya onye ọ bụ. Na ọ kpatachaala ego tupu ọ bụrụ gọvanọ. Na gọọmentị Ihedioha na-akpa agwa ka ụmụaka kama na ihe mere o jiri gba nkịtị bụ maka na ọ chọrọ udo n'Imo Steeti. Okorocha gara n'ihu kwuo na ọnọdụ ya n'ime Steeti ahụ dịka nke ọnọdụ onye nna n'ime ezinaụlọ bụ onye na-eme udo n'oge niile. Kirie nke a n'uju. Akụkọ ndị a ga-amasị gị: 'Ọ bụrụ na Naịjiria dị mma echeghi m na a ga-enwe IPOB' - Fr. Ebube Mmụọnsọ Iko ga-eme ka nwaanyị kwụrụọtọ nyụọ mamịrị Ụlọọrụ Inec dị n'Ọrlu Imo Steeti agbaala ọkụ Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ikpe", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51373401
Etu ndị uweojii si kụpụ onye otu anyị mkpụrụ ọkwụrụ n'anya - Enugu NGOs
Otu na-abụghị nke ndị gọọmenti emeela ngagharị iwe maka ihe ndị otu ha na-ahụ n'aka ndị uweojii n'Enugu.
2020-02-04T16:40:56Z
Police Brutality: Etu ndị uweojii si kụpụ onye otu anyị mkpụrụ ọkwụrụ n'anya maka ọrụ ya
Ndị mere ngagharịiwe n'Enugwu megide agwa ndị uweojii Otu na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị a kpọrọ Women's Aid Collective (WACOL) ngalaba Enugwu na ndị otu ndị ọrụ ndị ọzọ na-ekwuchitere ọhaneze ọnụ ha mere ngagharịiwe maka agwa ọjọọ ha sị na ndị uweojii 'Area Command' kpasịrị ha. Onyendu ha bụ Joy Ezeilo kọwara na otu nwagbọghọ ji anya mmiri gbata n'ụlọọrụ ha ma sị ka e nyere ya aka n'ihi otu nwaokoroọbịa dinara ya n'ike. NotTooYoungToRun emeela ngaghari iwe n'Abuja Akụkọ kachasị na'abali a: 'Oke idemmiri na-abịa, kee nkwụcha' Nke a mere ndị WACOL ji buru mkpesa nwagbọghọ a gaa n'aka ndị uweojii site n'aka onye ọkaiwu ha bụ Goodness Ibangah. Dịka a ka na-eme nyocha dị n'ime ya, nna nwaokoroọbia ahụ e chere na ọ kpara ego na ndị uweojii bidoro ịrịọ nwagbọghọ ahụ na ndị WACOL ka a kwụsị ikpe a. Mana ndị WACOL gwara ha na ọ bụghị ha ka ọ dịrị ịkwụsị ikpe ahụ na-aga n'ihu. Ezeilo kwuru n'ụbọchị 30 ọnwa Janụwarị, ndị uweojii mmadụ anọ bịara n'ụlọọrụ WACOL n'Enugwu, tie ọkaiwu Goodness Ibangah ọ nọ ndụ ọnwụ ka mma. Ọ sị na ndị uwojii kpụkwara ya gaa n'ụlọọrụ ha nke 'Area Command' mgbe ha kụchara ya ihe. Dịka ha hụrụ na nwaanyị a achọwala inwụ, ha ji ọsọ gaa dowe ya n'ụlọọgwụ 'National Orthopaedic' dị n'Enugwu. Ndị ọrụ enyemaka ahụ na-ekwu kwa na ndị uweojii kwụsị ị chụgharị ha bụ ndị na-enyere ndị mmadụ aka Nke a mere ndị WACOL na ndị ogbo ha bụ otu Coalition of Eastern Non Governmental Organisations (CENGOS) jiri mee ngaghariiwe na gburugburu Enugwu megide ndị uweojii. Ezeilo duru ndị otu ya gakwa n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugwu bụ ebe ha nyere kọmishịọna ndị uweojii akwụkwọ mkpesa ha. Mana ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii n'Enugwu bụ Daniel Ndukwe sị na Kọmishịọna uweojii bụ Ahmad Abdulrahman ehiwela kọmitii ga enyocha etu ihe niile ji mee. Ndukwe gwaara ndị WACOL ka ha ghara ịdị na ebuli okwu elu kama ka ha hapụ ndị uweojii ka ha rụọ ọrụ ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mba China sị ka anyị ghara ikwu maka Coronavirus - Onye Naịjirịa nọ na China Eji m ụkwụ bịa ụlọọgwụ mana ozugbo m nụrụ ihe na-eme, aganwuzịghị m ije - Onye rịaburu kansa Iko ga-eme ka nwaanyị kwụrụọtọ nyụọ mamịrị
[ "Naijiria", "Enugu Steeti", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Ikike ụmụnwanyị", "Ụmụnyanyị", "Enugwu", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51385105
"Ihedioha kwado ịga mkpọrọ" - Fada Mbaka
Fada Mbaka adọọla Ihedioha aka na ntị ka ọ kpachara anya ya ma ọ bụ ọ hụ onwe ya na mkpọrọ.
2020-02-05T11:22:33Z
Imo State: "Ihedioha kwado ịga mkpọrọ" - Fada Mbaka
Ụkọchukwu Ejike Mbaka Ụkọchukwu Ejike Mbaka Ụkọchukwu na-elekọta Adọration Mịnịstrị n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ewerela olu ike baara gọvanọ Imo steeti pụrụ apụ bụ Emeka Ihedioha mba. Mbaka gwara Ihedioha ka ọ kpachara anya ya na 'ganị ganị' niile ọ na-akpọ kemgbe a chụpụrụ ya n'oche, ma ọ bụrụ na ọ chọghị iga ụlọ mkpọrọ. Ọ bụ sọ Mbaka ka Chineke na-agwa okwu? - PDP Imo steeti Ụkọchukwu ahu kwuru na afọ juru ya nke ukwuu etu ụlọikpe kachasị si kpee ikpe Ihedioha na Hope Uzodinma bụ onye nọchiri ya dịka gọvanọ ugbua. Ọnụokwu Mbaka Ọ gwakwara ndị mmadụ ka ha kwụsị ịgbagha maọbụ na-ekwu okwu ọjọọ maka amụma ya niile. Cheta na Emeka Ihedioha gwara BBC Igbo na mkaprịtaụka, na a gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị. Mbaka jikwa ohere ahụ tinye ọnụ n'okwu gbasara ndị ụkọchukwu ibe ya na soshal midia. Ọ kwara arịrị na ndị ụkọchukwu ibe ya bụzị ndị na-agba ya mgba ugbua na soshal midia. O kwuru na ọ bụ ihe ihere dịịrị onye ọbụla tinyere ọnụ na-akatọ ya n'ụdị ọbụla. Mbaka gwara ndị fada ibe ya nakwa ndị nkịtị, ka ha ghọta na onyinye dị iche iche. "N'ihi ya, onye ọbụla ekwesịghị inwere m anya ụfụ n'ihi na amụma m na-emezu oge niile," ka o kwuru. Akụkọ ga-amasị gị: Amalitela ịna 7.5% VAT maka oku na ozi ekwentị Ndịagha bịara na-amaja ndị Afaraukwu Ibeku - Emmanuel Kanu Mba China sị ka anyị ghara ikwu maka Coronavirus - Onye Naịjirịa nọ na China Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Imo steeti", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51383055
Tank mmiri adagbuola ụmụakwụkwọ abụọ na Nkpọr-agu, Anambra state
Ihe mberede ezinaụlọ ataala isi ụmụaka abụọ gara akwụkwọ n'ụtụtụ Wenezde.
2020-02-05T17:05:14Z
Anambra state: Tank mmiri adagbuola ụmụakwụkwọ abụọ na Nkpọr-agu, Anambra state
Ihe mberede ezinaúló Ọdachi dakwasara ụmụaka abụọ si be nne na nna ha gawa akwụkwọ n'ụtụtụ Wenezde ka nnukwu ugbommiri Bekee kpọrọ tank mmiri juru na ya dakwasara n'elu ụlọakwụkwọ ha. Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed si dee, ya bụ arụ mere mgbe o ji nkeji iri na ise gafee elekere iri na otu nke ụtụtụ, na Royal Kings Foundation Nursary and Primary School dị na Nkpor-Agu nke dị n'okpuruọchịchị Idemili Nọt n'Anambara steeti. Dịka o si kọọ, ya bụ ugbommiri dị galọn 800 si n'ụlọ dịketere ụlọakwụkwọ ahụ dabata n'ime ụlọakwụkwọ were dakwasa n'elu ụlọakwụkwọ ahụ. Nke a metụtara ụmụakwụkwọ anọ bụ nke ebu gawa ụlọọgwụ Idemili dị na Nkpor, bụ ebe mmadụ abụọ n'ime ha nọ nwụọ. Mmadụ abụọ ahụ bụ Wisdom Ezewudo gbara afọ atọ nakwa nke nwaanyị gbara afọ abụọ bụ nke amatabeghị aha ha ugbua. Mmadụ abụọ ndị ọzọ na-erubeghị afọ abụọ na-anabata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ka ọ dị ugbua. Ndị uweojii ka na-enyonye anya n'ihe butere ọdachi a. Ụgbọelu ndị njem akpọkasịala na mba Turkey Otu ụgbọelu bu mmadụ 171 chipuru n'ụzọ ya kpọkaa n'ala n'ọdọụgbọelu dị n'Istanbul, isiobodo mba Tọki. Ya bụ ụgbọelu kụjara ụzọ atọ ma merụọ mmadụ iri abụọ na otu ahụ. Ihe mberede ụgbọelụ Texas ataala isi mmadụ iri Mmadụ 257 anwụọla na mberede ụgbọelu Mmadụ 257 anwụọla na mberede ụgbọelu Enweghị onye nwụrụ na ya bụ ihe mberede mere na mgbede taa bụ ụbọchị ise nke ọnwa Febrụwarị 2020, dịka Minista na-ahụ maka njem bụ Mehmet Cahit Turhan kwuru. Gọvanọ steeti ahụ bụ Ali Yerlikaya sị na mmadụ 21 ahụ merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ. Ya bụ ụgbọelu ndị njem nke ndị Pegasus Airlines si ọdịda-anyanwụ mba ahụ bụ Izmir bata Istanbul ka oke mmiri na-ezo. A kpọpụtachara ndị nọ na ya bụ ụgbọelu gụnyere ndị ọrụ ha mmadụ isii, na ndụ. Ihe nkiri ndị mmadụ na-eke na soshal midia gosiri ọkụ na-agba n'ime ụgbọelu a, mana ndị ọrụ mmenyụ ọkụ bịara menyụọ ya ozugbo. 'Snow' ekpugidela mmadụ 38 Ndịagha na ndị obodo ahụ na-enyere aka ịzọpụta ndị 'snow' kpugidere n'ụgbọala ha Mmadụ iri atọ na asatọ anwụọla ebe ihe karịrị mmadụ iri ọzọ na-eche ka a gbatara ha ọsọ enyemaka dịka nnukwu snow dara ọzọ ma kpuchite ha n'ugwu dị na mba Tọki. Ka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ narị atọ na-agba mbọ inyere ndị mmadụ aka, dịka a na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị ihe a gburu nwereike ịrị. Maka ụmụnwoke 47 a na-ekpe ikpe mmekọrịta Ụlọikpe dị na Legọs eyigharịkwaala ụbọchị ha ga-ekpe ikpe dimkpa nwoke iri anọ na asaa e boro ebubo mmekọrịta nwoke na nwoke ibe ya n'ezi. Ọkaikpe nọ n'elu ikpe ahụ kwuru sị na ọ ga-akụpụ ikpe ahụ mgbe ọzọ ha ga-agbakọta ma ọ bụrụ na ndị gbara dimkpa ndị a akwụkwọ akpọtaghị akaebe ga-eme ka ikpe a gaa n'ihu. Fada Mbaka na-abara Emeka Ihedioha mba Ụkọchukwu na-elekọta Adọration Mịnịstrị n'Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ewerela olu ike baara gọvanọ Imo steeti pụrụ apụ bụ Emeka Ihedioha mba. Mbaka gwara Ihedioha ka ọ kpachara anya ya na 'ganị ganị' niile ọ na-akpọ kemgbe a chụpụrụ ya n'oche, ma ọ bụrụ na ọ chọghị iga ụlọ mkpọrọ. Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a: "Ihedioha kwado ịga mkpọrọ" - Fada Mbaka Ighalo na Manchester United Odion Ighalo gbabuuru Naịjirịa bọọlụ akọwaala ihe mere o ji kwere isi Shanghai Shenhua dị na Chaịna bịa ịgbara Manchester United bọolụ. Ighalo kwuru na ọ bụ maka etu o si anụ ya ọkụ n'obi mere o ji kwere ka Man Utd ghara ikwuzu ya ụgwọ, ma ya bụrụ na ọ gbaara ha bọọlụ. Amalitela ịna 7.5% VAT maka oku na ozi ekwentị Ọnụahịa ịkpọ oku nakwa izikọrịta ozi n'ekwentị agbagoola. Nke a bụ maka na ụlọọrụ ekwentị amalitela ịna ụtụisi VAT pasentị asaa na ụma ise maka oku ọbụla ha kpọrọ nakwa ozi ọbụla ha ji ekwentị zipu. Obi ụmụ Naijiria na-asụ ka ofe maka mbuli ụgwọ VAT Onye ọbụla nara ụtụisi n'ahịa a ga-akpụpụ ya ụlọikpe - Adinuba MTN: A daala ha nha nnukwu ego ọzọ n'ime otu izu BBC Igbo chọpụtara nke a n'ụbọchị Wenezde mgbe ya bụ ihe malitere iwu na soshal midia Twitter. Ọtụtụ ndị mmadụ gbarụrụ ihu maka ya bụ ihe, na-ekwu na nke a gosiri n'ihe na-esiwanye ike na Naịjirịa. Iji maa atụ, ozi 'sms' a na anabu naịra anọ bụzị naịra anọ na kobo iri ugbua n'ihi VAT. Cheta na onyeisiala Buhari binyere aka n'iwu a kpọrọ 'Finance Act' n'ọnwa Janụwarị. Iwu ahụ kwuru na a ga-ebuli ụtụisi 'value added tax' (VAT) site na pasentị ise ruo pasentị asaa na ụma ise. Iwu ahụ malitere n'uju n'abalị mbụ nke ọnwa Febrụwarị a. Anambra steeti enweela ụlọikpe mkpegharị Gọvanọ Anambara bụ Willie Obiano Gọvanọ Willie Obiano nke Anambara steeti emgheela ụlọikpe mkpesa ọhụrụ n'ọka. Nke a bụ nke mbụ Anambra steeti ga-enwe ụlọikpe mkpesa kamgbe afọ iri abụọ na itoolu e kewara steeti ahụ na Enugu. Obiano kwuru na ihe kpatara ọchịchị ya ji malite ịrụ ya bụ ụlọikpe mkpegharị bụ iji belata oke mgbagharị ndị ọkaiwu steeti ahụ na-agbagharị n'okporo ụzọ. O kwuru na ọ bụ n'Enugwu ka a na-ebuga ikpe niile si Anambra steeti maka mkpegharị. Na Lesotho Taa ka a ga-amalite ikpe nwunye praịm mịnịsta mba Lesotho bụ Maesaiah Thabane ikpe maka ebubo igbu nwunye di ya. Ndị uweojii Lesotho na-enyokwa praịm mịnịsta ahụ enyo maka ọnwụ nwunye ya nke mbụ bụ onye ya na ya na-esebu okwu. Maesaiah gbaburu ọsọ gbaga mba Saụt Afrịka nke mere ka ndị uweojii Lesotho wepụta aha ya dịka ọnye a na-achọ achọ. Mana a nwụchiri ya ụbọchị Tuzde oge ọ gara kpee onwe ya n'aka ndị uwe ojii. Otooto C Ronaldo Ụwa niile kpụ Cristiano Ronaldo n'ọnụ ugbua dịka ọ na-eme emume ncheta afọ iri atọ na ise ya. Ọtụtụ na-ajụ mmụọ na-akụrụ Ronaldo egwu nke o ji akpa ike niile ọ na-akpa n'egwuregwu bọọlụ. Onye bọọlụ ọzọkwa na-eme ncheta ọmụmụ ya n'ụbọchị Wenezde bụ Neymar nke mba Brazil. Trump na Pelosi Pelosi dọkara akwụkwọ ozi Trump e nyere ya Obi akpọ dị n'etiti onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Nancy Pelosi dịka ọ na-akawanye njọ. Ha abụọ gosiri ụwa niile n'ụbọchị Tuzde na ha esighi otu ụzọ aga. Ihe atụmatụ 'Impeachment' Trump pụtara Ihe ga-eme ugbua n'okwu nchutu Trump Ụzọ anọ Buhari jiri yie Trump Trump gara ụlọomeiwu ịgwa ndị Amerịka okwu nke a kpọrọ 'State of the Union, mana ọ jụrụ ikwe Pelosi n'aka. Pelosi n'onwe ya dọriri akwụkwọ okwu Trump nke e nyere ya. O kwuru na onweghi otu mpụrụ eziokwu ọ hụrụ n'ime ya. Trump ekweghi Pelosi n'aka N'okwu ya, Trump kwuru na ọchịchị ya emeela ka Amerịka nwee ugwu ọzọ. O kwuru na ihe ruru nde mmadụ asaa nwetara ọrụ kamgbe ya banyere n'ọchịchị. Oge Trump na-ekwu okwu, ndị otu pati ya bụ 'Republican' nọ n'etu ya aha, ma na-ekwu na ọ ga-achị afọ anọ ọzọ. NLC adọọla gọọmentị etiti aka na ntị Onyeisi NLC bụ Ayuba Wabba Otu jikọrọ ndịọrụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Labour Congress' adọọla gọọmentị etiti aka na ntị ka ha ghara ịkpatụ ego e ji akwụ ndị lara ezumike nka ụgwọ aka. Onyeisi otu a bụ Ayuba Wabba kwuru nke a n'ụbọchị Tuzde n'ihi kepukepu a na-anụ na gọọmentị etiti chọrọ igbaziri tarị Naịra abụọ n'ime ego 'pension'. Ayuba kwuru na anya NLC dị n'ego 'Pension' ahụ maka na ọ bụ ọbara na ọsụsọ ndị ọrụ. O kwuru na gọọmentị ka ji ndịọrụ lara ezumike ụgwọ ruru narị ijeri naịra anọ (N400 billion). 'Customs' anwụchiela nde dọla asatọ Onyeisi 'Customs' bụ Hameed Ali na-egosi ego ahụ ha jichiri Ngalaba na-ahụ maka mbubata na mbupu ngwaahịa na Naịjirịa bụ 'Customs' ekwuola na ha jichiri nde dọla asatọ na ụma bụ nke ndị omekome chọrọ iji ụzọ aghụghọ bupu na Naịjirịa. Onyeisi Custom bụ Hameed Ali gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ n'ọnwa Janụwarị ka ya bụ ihe mere. Ali kwukwara na ha nwụchiri mmadụ abụọ na-arụ ọrụ n'ọdọụgbọelu dị na Legọs n'ihi ya bụ okwu. Ọ kọwara na ọ bụ ndị ekperima, ndị na-ebu ọgwụike maọbụ ndị nrụrụ aka na-achọkarị ụzọ ibupu ego n'ụzọ di otu ahụ. Ali dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla na-eme njem ịpụ na Naịjirịa gbaa mbọ hụ na ọ gwara ndị ọrụ nchekwa ma ọ bụrụ na o ji ihe karịrị puku dọla iri n'akpa ya. Ụmụaka Liverpool enwetala mmeri Otu egwuregwu bọọlụ Liverpool agafeela n'agba nke ise nke FA cup oge ha ji otu ọkpụ goolu merie Shrewsbury Town n'abalị Tuzde. Mmeri a tụrụ ndị mmadụ n'anya n'ihi na Liverpool ji naanị ụmụaka wee gbaa ya bụ bọọlụ maka na ndị nnukwu nọ ezumike. Ro-Shaun Williams nke Shrewsbury nyere onwe ha goolu na ya bụ asọmpi. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: A gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị - Emeka Ihedioha Ndịagha bịara na-amaja ndị Afaraukwu Ibeku - Emmanuel Kanu Mba China sị ka anyị ghara ikwu maka Coronavirus - Onye Naịjirịa nọ na China Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "International Labour Organization", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Donald Trump", "Amerika", "Liverpool F.C.", "Bọọlụ", "Akụ na ụba" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51396058
NERC enyela EEDC iwu ka ha kwụsị ibupu igwe ọkụ meter n'ike
Ndị mmadụ na-atamu maka etu ụlọọrụ EEDC si akpaso ha agwa n'Enugu steeti.
2020-02-06T13:41:25Z
Prepaid Meters: NERC enyela EEDC iwu ka ha kwụsị ibupu igwe ọkụ meter n'ike
'Meter' ọkụ latrik Ndị mmadụ kwuru na ndị EEDC na-ebupu 'meter' ochie ha n'ike ma na-ana ha puku naịra 39 iji tinye nke ọhụrụ Ụlọọrụ na-ahazi ka ndị na-enye ọkụ si arụ ọrụ ha na Nigeria bụ 'National Electricity Regulatory Commission' (NERC) enyela ndị Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) iwu ka ha kwụsị ibupu igwe 'meter' ndị mmadụ n'ike na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjiria. Onyeisi ndị NERC n'Enugwu steeti bụ Frank Okafor gwara ndị EEDC ka ha malite itinyere ndị mmadụ meter ọhụrụ ahụ ngwangwa ha wepụrụ nke ochie na-akwụghị ụgwọ ọbụla. NERC ebulibeghị ụgwọ ọkụ latrik ọbụla Gọọmentị na ndị Discos na-ama aka onye mere Naịjirịa ejighi nwee ọkụ Ndị nọ na ya bụ nkwekọrịta bụ otu Ndigbo United Forum, EEDC nakwa NERC. Frank Okafor, onyeisi Ndigbo United Forum Cheta na otu Ndigbo United Forum haziri ngagharịiwe n'Enugwu n'ọnwa Jenụwarị, maka atụmatụ ahụ ndị EEDC wepụtara. Atụmatụ ndị ahụ gụnyere na kamgbe Jenụwarị 2020, EEDC malitere wepụwa meter ọkụ ochie wee sị ndị mmadụ kwụọ puku naịra 39 n'ụma tupu ha enye nke ọhụrụ. Ndị Igbo United Forum nke onyeisi ha bụ Chinedu Mba kwara arịrị na EEDC kwụsịkwara ndị niile nwere meter ochie ịzụta ọkụ nke mere na nhịahụ dị n'inwe ọkụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ kamgbe ọnwa Jenụwarị. Ndị NERC gwakwara EEDC ka ha leba anya ka akparamagwa ndịọrụ ha siri dị na ebe ndị mmadụ nọ nakwa ihe ise ọzọ ha kwekọrịtara na EEDC ga-eme. Akụkọ ọzọ ga-amasị gị: Ị ma maka Ben Enwonwu, aka na-ese ncha? Mkpebi na ikpe amaghị Trump ewetela atụmatụ 'impeachment' na njedebe A gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị - Emeka Ihedioha Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Enugu Steeti", "Enugwu", "Ike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51400945
Ihe mere Trump ji ewusi ike na Naịjirịa
Dịka ude Trump na-ede, ọtụtụ mmadu si ọwụwa anyanwụ so n'ime ndị na-enye nwaamadị a ezigbote nkwado.
2020-02-06T15:12:52Z
Donald Trump: Ihe mere Trump ji ewusi ike na Naịjirịa
Donald Trump Na nyocha ngalaba "Pew Research Center" (PRC) mere nke BBC jiri dee akụkọ n'ọnwa Jenụwarị 2020, Naịjirịa pụtara dịka nke anọ n'ime mba ndị kachasị hụ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump n'anya. Ịhụnanya a, n'agbanyeghị na ọ na-agbagwoju ọtụtụ mmadụ anya, pụtakwara n'ihe dịka atụmatụ ichutu Trump na-enwu ọku n'Amerịka. Ka Trump mechara nweta mkpebi ọ ga-eji wee ka nọrọ n'ọkwa dịka onyeisiala Amerịka, ndị mmadụ na Naịjirịa pụtakwara n'igwe na-enwe aṅụrị maka ya. Ihe atụmatụ 'Impeachment' Trump pụtara Ihe ga-eme ugbua n'okwu nchutu Trump Mkpebi na ikpe amaghị Trump ewetela atụmatụ 'impeachment' na njedebe Alexander Otti, otu onye a ma dịka onye na-akwado Trump ọfụma na Facebook sị na mmeri Trump bụ mmeri banyere ndị ọ kpọrọ "Swamp". Okwu Otti bụ ihe ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ndị si ọwụwa anyanwụ Naịjirịa na-ekwu. Tchidi Chimezim sọkwa n'otu aka ahụ enwe aṅụrị maka mmeri Trump meriri. Ọnụ okwu bụ ihe anaghị achọ achọ na soshal midia nke Naịjirịa; maọbụ na Twitter, Facebook na WhatsApp. Mana, ajụjụ so ya wee bụrụ, ọ ginị mere o jiri dị etu a? Ọkachasi ma e tinye anya n'etu ọtụtụ ndị mmadụ na-ede ma na-ekwu na Trump bụ onye na-akpa oke agbụrụ nke ukwu. Trump bụ onye ụka Ọtụtụ ndi isi ụka na Amerịka na-akwado Trump Ide Ben Bennet Udeogu, bụ onye ihe Trump na-amasị nke ukwu bi n'Ugwu Awụsa gwara BBC Igbo na ihe mere ndị si Ọwụwa Anyanwụ ji na-akwado Trump abughị ihe kwesịrị ị na-agbagwoju ndị mmadụ anya. Ide Udeogu sị: "Ọtụtụ ndị agbụrụ anyị bụ ndị na-eso ofufe Kraịst. Trump na onwe ya bụ onye na-ekwu na ọ ga na-agba mbọ ịhụ maka ọdịmma ndị ofufe Kraịst." Ọ gakwara n'ihu kwuo na Trump egosila na ọ ga-emezu nkwa o kwere. "Leenu etu Trump siri gwa Onyeisiala Muhammadu Buhari oge ọ gara njem n'Amerịka na ya agaghi anọ hụ na emekpara ndị ofufe Kraịst ahụ na Naịjirịa." Ide Udeogu, n'ịsa ajụjụ maka mmachi Trump machiri ndị Naịjirịa ịbata Amerịka ịbịa obibi, sị na ọ bụghị Trump ka nke a dị n'aka. "Ọ bụ ọnọdụ Naịjirịa nọ butere atụmatụ ahụ." Mana onye ọzọ bụ nwaafọ Naịjirịa bi na Nọt Karolịna dị n'Amerịka bụ Kommanda Ezu ekweghi na Trump bụ onye ụka. Ọ masịghi ụfọdụ ndị na-akwado Trump na Naịjirịa oge o zutere Onyeisiala Buhari n'Amerịka "I nnyochaa etu ndị uka si akpa agwa, ị hụ na Trump abụghịdị ya ma ncha." N'agbanyeghi nke a, ọ sị na ọ ga-amalite ikwado Trump. "Ọ bụ Hillary Clinton ka m tụnyeere vootu n'afọ 2016. Mana ugbua, ọ bụ Trump ka m ga-atụnyere." Maazị Ezu sị na ihe kpatara nke a bụ na Trump na-emezu ihe o kwuru. "Ihe niile Trump kwuru na ọ ga-eme tupu ọ rigoo n'ọkwa ka ọ na-eme ugbua." Maazị Ezu sịkwa na n'agbanyeghi na o kwenyere na Trump so na-akpata oke agbụrụ n'Amerịka, ọ ga-atụrụ ya maka na "o nweghi onye ga-emerinwu ya n'ogige ndị Demokrat". Maka mmachi ndị Naịjirịa, ọ sị na ndị ọ dị n'aka bụ ndị na-achị Naịjirịa. "Ọ bụ Naịjirịa ka Trump sị ndị Naịjirịa ghara ịbata? Ọ kwa Amerịka? Ọ bụrụ na Naịjirịa dị mma, dị mmadụ a ga-achọ ịkwaga Amerịka?" 'Trump kwenyere na Biafra' Ihe ọzọ na-eme ka ọtụtụ ndị ọwụwa anyanwụ jiri na-akwado Trump bụ okwu Biafra. Ndị na-akwado Biafra na-apụtakarị na soshal midia etinye foto Trump maọbụ ihe onyonyo ya. Oge Trump meriri na 2016, ndị na-akwado Trump mekwara ngagharị ọṅụ na Pọt Hakọt. Ide Udeogu rụtụkwara aka na nke a mgbe o kwuru maka njem onyeisi otu na-acho Biafra bụ Nnamdi Kanu gara n'Amerịka. "Trump kwenyere n'ihe ndị na-achọ Biafra na-eme. Ọ bu ihe mere o jiri kpọọ Nnamdị Kanu ka ọ bịa ebe ọ na-achụ nta vootu ka ọ hụ etu ihe si aga." Nke bụ eziokwu bụ na ndị mmadu ka ga na-akwado Trump na mpaghara a, n'agbanyeghi na o nweghi ihe ọbụla gosiri na Trump ma maka ha maọbụ kwenyere na ha. Akụkọ ga-amasị gị: Mkpebi na ikpe amaghị Trump ewetela atụmatụ 'impeachment' na njedebe Ị ma maka Ben Enwonwu, aka na-ese ncha? "Ihedioha kwado ịga mkpọrọ" - Fada Mbaka "Ịgba egwu Salsa zọrọ ndụ m"
[ "ịkpa oke", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Donald Trump" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51396055
'Ọ bụ PDP ka ọ dịrị ịsa Mbaka okwu' - Onye mgbasaozi Ihedioha
Ọnụ na-ekwuru Ihedioha sị na onweghi okwu ha nwere ịgwa Fada Mbaka maka ihe ọhụrụ o kwuru maka ha.
2020-02-06T18:30:10Z
Imo State: 'Ọ bụ PDP ka ọ dịrị ịsa Mbaka okwu' - Onye mgbasaozi Ihedioha
Odeakwụkwọ mgbasaozi akachiburu Imo steeti bụ Chibuike Onyeukwu‎ sara Rev. Fr. Ejike Mbaka nke Adoration Ministry okwu ọ gwara Emeka Ihedioha. Ọ sị na ha 'agaghị asa Mbaka okwu ọbụla gbasara ihe ahụ o kwuru maka na ọ bụghị ha ka ọ diiri ịsa ya bụ okwu'. Mbaka agọrọla aka na ụkwụ ya n'okwu Buhari "Ihedioha kwado ịga mkpọrọ" - Fada Mbaka Ọ sị na ọ bụ pati ha bụ PDP ka ọ bịịrị ịsa ya bụ okwu. N'oziọma o ziri n'Adoration ministry n'izu a, Mbaka dọrọ Ihedioha aka na ntị ya kpachara anya maka ihe ọ na-ekwu gbasara ọchịchị ya ụlọikpe kachasị kpagburu. Mbaka sị na ọ bụrụ na Ihedioha akpachaghị anya, ọ gaa mkpọrọ maka okwu ya. Sineti ahọpụtala ndị ga-etinye anya n'akwụkwọ iwu Naịjiria E bughi m ọkwa ụlọomeiwu gbapụ Onyeisioche ụlọomeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan akpọpụtala aha mmadụ iri ise na isii (56) dịka Kọmitii ndị otu ya hibere ilebanye anya na maka ịhazigharị iwu Naịjria. Lawan kwuru nke a n'ọgbakọ ndị Sineti taa bụ Tọzde, ebe ọ nọ kwuo na esetechere mmadụ n'ọgbọnta vootu dị icheiche ime ka ndị ọbụla nwee ndị nnọchiteanya na ya bụ kọmitii. Ebughi m 'mace' gbaa ọsọ kama ha kpara nkata ịchụ m n'azụ - Acho Ihim Sinetị akwụsịla akwụkwọ iwu ntuliaka Ndị nwere agba na ya bụ kọmitii gụnyere: Osote onyeisoche Sinet bụ Ovie Omo-Agege (Onyeisioche kọmitii); Onyendu Sineti, Yahaya Abdullahi; Osote onyendu, Ajayi Boroffice; Onyeisi pati ndị ejighị ọchịchị, Enyinnaya Abaribe; Osote ọchọudo nke Sinet akpọro Deputy Whip, Aliyu Sani Abdullahi; Onye na-esote onyeisi ndị pati na-anoghị n'ọchịchị, Emmanuel Bwacha; Ọchọudo nke ndị pati na-anọghị n'ọchịchi bụ Minority Whip, Philip Aduda; na osote ya bụ Deputy Minority Whip, Sahabi Alhaji Ya'u. Ndị omeiwu ahọtara na mpaghara dị icheiche bụ:Theodore Orji, Abịa; Aishat Ahmed, Adamawa; Bassey Akpan, Akwa Ibom; Stella Oduah, Anambara; Haliru Jika Dauda, Bauchi; Biobarukuma Deji-Eremenyo, Bayelsa; Gabriel Suswam, Benue; Abubakar Kyari, Borno; Gershom Bassey, Krọs Riva; James Manager, Delta; Samuel Egwu, Ebonyi; Matthew Urhoghide, Edo; Opeyemi Bamidele, Ekiti; Ike Ekweremadu, Enugwu; na Mohammed Danjuma Goje, Gombe. Ndị ọzọ bụ: Rochas Okorocha, Imo; Sabo Mohammed, Jigawa; Uba Sani, Kaduna; Kabiru Gaya, Kano; Baba Ahmed Kaita, Katsina; Mohammed Adamu Aliero, Kebbi; Smart Adeyemi, Kogi; Suleiman Sadiq Umar, Kwara; Oluremi Tinubu, Legọs; Abdullahi Adamu, Nasarawa; Mohammed Sani Musa, Naịja; Ibikunle Amosun, Ogun; Nicholas Olubukola, Ondo; Surajudeen Ajibola, Ọshụn; Teslim Folarin, Ọyọ; Hezekiah Ayuba, Platu; George Thompson Sekibo, Rivas; Aliyu Wamakko, Sokoto; Yusuf A. Yusuf, Taraba; Ibrahim Geidam, Yobe; nakwa Mohammed Hassan, Zamfara. Ndị nnọchịteanya ọgbọnta sineti bụ: Bala Ibn Na'Allah na Ibrahim Shekarau, Nọt-Westị; Kashim Shettima na Lawal Yahaya, Nọt-Ist; Tanko Al-Makura na Yakubu Oseni, Nọt-Sentralụ; Abdulfatai Buhari na Biodun Olujimi, Saụt-Westị; Lilian Uche Ekwunife na Chukwuka Utazi, Saụt-Ist; Rose Oko nakwa Akon Eyakenyi, Saụt-Saụt. Ndị Red Cross akwadola maka Coronavirus Nigerian Red Cross sị na ha nwere ndị ji aka họpụta onwe ha inyere aka ma ọ bụrụ na ọrịa coronavirus mechaa tinye isi na Naịjiria Ngalaba gbatagbata maka ahụike bụ Nigerian Red Cross, ekwuputela na ha agwala mmadụ otu nde ka ha saa anya mmiri maka ịkwụsị mgbasa ọrịa coronavirus na Naịjiria. Abubakar Ahmed Kende bụ odeakwụkwọ ha, kwuru na ha na ụlọọrụ Nigerian Centre for Disease Control na-arụkọ, ịhụ na ha busoro ọrịa agha. Coronavirus adịbeghi na Gana Ndị mba Gana ekwuola na ha achọtaghị ọrịa coronavirus n'ahụ mmadụ abụọ a na-enyochabu maka ya na mba ha. Mmadụ abụọ ahụ bụ otu onye Chaịna na onye Ajentina, ji aka ha gaa ụlọọgwụ ka ha na-arịa ọrịa dị ka o yiri coronavirus tupu e nyochawa ha. Naịjiria nwezịrị naanị pati 18 Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ nke Bekee kpọrọ Independent National Electoral Commission (INEC) ewetuola ọnụọgụgụ otu pati nọ na Naịjirịa site n'iri isii na asaa ruo iri na asatọ. Onye kwuru nke a bụ onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu n'Abuja taa. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Pati nọ na Naịjiria ga-abụzị naanị 18 - Inec Trump ga-achiri gawa Onyeisiala Amerịka Donald Trump Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nwetere ohere ịchịri gawa n'ihu dịka ndi omeiwu kpebiri na o metaghi ihe a ga-eji chụọ ya n'ọrụ. Ndị sineti Amerịka mere ntuliaka n'abalị Wenezde iji mara ndị kwadoro ka Trump rituo n'ọchịchị maka ebubo nrụrụaka Ụlọ Omeiwu Nta boro ya ma jiri mee ya ihe Bekee kpọrọ "Impeachment". Ihe ga-eme ugbua n'okwu nchutu Trump Amerịka ga-eso ụzọ udo - Trump Ka e mechara ntuliaka a, mmadụ 52 ekwenyeghị ka a chutuo Trump ebe mmadụ 48 kwenyere. Naanị otu onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị Repọblikans, bụ nke Trump nọ na ya, kwenyere ka a chutuo onyeisiala ahụ maka nrụrụaka Ụlọ Omeiwu Nta kpebiri na o mere site n'isi Onyeisiala Yụkren nyochawa Maazị Joe Biden na nwa ya nwoke Hunter. Aha ya bụ Mitt Romney. Mitt Romney sị na ọ bụ maka iyi ya nwụrụ n'ihu Chineke mere ya agaghi ahụ eziokwu sị na o bụ asị. Mana, n'atụmatụ ọzọ banyere igbochi nyocha ndị Ụlọ Omeiwu Nta na-eme maka nrụrụaka ha sị na Trump mere, Maazị Romney sị na nke ahụ adabaghị maka ndị Omeiwu Nta emeghị ihe nnile na kwesiri ime maka ya. Nke a pụtara na mmadụ 47 kwenyere ka achụọ ya n'atụmatu ahụ ebe mmadụ 53 si ka ahapụ ya. Atụrụ vootu ndị n'usoro pati, dịka ndị Democrat tụru ka Trump puọ ebe ndị Repọblịkan sị ya nọdụ. Trump nwetere ọchị n'okpuru patị Repọblịkan. Ntuliaka 2020 Trump na-akwado iso zọọ ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ na ntuliaka a ga-eme n'afọ a. Otu nta vootu ya kwuru na mmeri a gosiri na Trump ga-eturukwa ugo ọzọ. Trump n'onwe ya kwuru na ya ga-etinye ọnụ n'okwu ahụ n'ụbọchị Tọzde. Etu ndị mmadụ si nabata ya Ụfọdụ ndị mmadụ na soshal midia na-aṅụrị ọṅụ maka mmeri Trump n'ụlọomeiwu ukwu. Ha kwuru na nke ahụ gosiri na aka onyeisiala ha dị ọcha. Mana ndị ọzọ kwuru na ya bụ ikpe agazighi nke ọma. Ndị omekome agbatughị ụgbọelu anyị - Ndị uweojii Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ndị uweojii Naịjirịa sị na ọbụghị eziokwu na ndị omekome gbaturu ụgbọleu Helicopter ha na steeti Kaduna. Akụkọ malitere ifegharị n'ụbọchị Wenezde na ndị omekome gbaturu ụgbọelu ndị uweojii oge ha gara ibuso ha agha. Mana Frank Mbah bụ ọnụ na-ekwuru ndi uweojii si na ọ bụ eziokwu na mgbọ tụrụ ya bụ ụgbọelu maka ọ daghị. Ọ sịkwa na ha gburu ihe ruru ndị omekome narị abụọ na iri ise n'agha ụgbọelu ahu gara. Tanker agbaala ọkụ na Legọs. Ọkụ ahụ egbughi mmadụ maọbụ merụọ mmadụ ahụ Ndị ọrụ gbatagbata nke Legọs state kwuru na otu ụgbọala bu mmanụ petrol dara ma nwuru okụ na mpaghara Abule Osun na steeti ahụ. Mana onweghị onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na ihe mberede ahụ. Ha kwukwara na ndịọrụ ha na agba mbọ ịgbanyụ ọkụ ahụ ma mepee ụzọ ka ndị mmadụ gafewe. Ntuziaka maka akara ekwentị Dr Isa Ali Pantami Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi ekwentị bụ Isah Pantimi enyela ntuziaka ọhụrụ maka akara ekwentị. O kwuru na tupu mmadụ edenye akara akwantị ya, onye ahụ ga-enwerịrị akara njirimara bụ National Identification Number. Pantimi kwukwara na otu onye agaghị enwekarị akara ekwentị atọ bụ nke e debanyere n'aha ya. Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-akpọchị akara ekwentị ọbụla nke onye nwe ya jiri mee ihe ọbụla na-adabaghị n'iwu. Kirk Douglas alaala mmụọ Kirk Douglas na nwa ya bụ Michael Douglas Onye eji ihe onyoonyoo Hollywood mara bụ Kirk Douglas anwụọla ka ọ gbara afọ otu narị na atọ. Kirk Douglas bụ nna Michael Douglas onye bụkwa onye a ma ama na Hollywood. Akwa ọhụrụ ndị 'Super Eagles' Akwa ọhụrụ ndị ụlọọrụ Nike rụpụtara maka ndị otu egwu bọọlụ 'Super Eagles' nke Naịjirịa na-ekpo ọkụ ebe niile. Ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbu bụ ma ọ ka nke ochie mma. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: "Ihedioha kwado ịga mkpọrọ" - Fada Mbaka A gbawara ndị Imo Steeti aka napụ ha ọchịchị - Emeka Ihedioha Tank mmiri adagbuola ụmụakwụkwọ abụọ na Nkpọr-agu, Anambra state Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Donald Trump", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51410890
Buhari ka na-ekwukwa na ya 'meriri' Boko Haram
Njakịrị bụ ihe ụmụ Naịjirịa na-ama okwu onyeisiala kwuru maka mmeri Boko Haram n'elu soshal midia.
2020-02-07T08:33:17Z
Boko Haram: Ihe ndị mmadụ sara Buhari maka 'mmeri' Boko Haram
Onyeisiala Naíjiría na-ekele ndí agha Naíjiría Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru n'ụbọchị Tọzde na mmeri ọchịchị ya meriri Boko Haram ebutela Nịajirịa nsọpụrụ n'ụwa niile. Dịka ụlọ ntaakụkọ Premium Times siri kọwa, o kwuru nke a n'ozi oziri n'ọgbọ Eagles Square nke dị n'Abuja. Buhari ka na-ekwusi ike na Boko Haram enweghịzị ume Etu Boko Haram si gbuo onye ọrụ enyemaka N'ọnụ onyeisiala "Ị ga-ekweta na mmeri anyị nwetara enyeghachila anyị nsọpụrụ na ugwu n'ụwa niile". Nke a mere ka ụfọdụ mmadụ jiri okwu ya maa njakịrị n'elu soshal midia. Onye dịka Ephraim Jidauna sị ya kedụ ebe mmeri ahụ dị n'ihi na ụjọ ka jide ọtụtụ mmadụ ugbua karịa na mbụ. King Davies kwuru na ndị na-adụ ya ndụmọdụ bụ ndị iro Naịjirịa n'ihi na onyeisiala Buhari amaghị ihe na-akpọtụ n'obodo. Teesleek na-ajụ ma Onyeisiala ebikwa na Naịjirịa chaa chaa? Roun kwenyere n'okwu ha na-ekwu na Buhari amaghị etu ihe si kwụrụ ya mere o ji aṅụrịrị maka mmeri ya Nchọpụta nke Premium Times mere gosiri na ihe karịrị mmadụ narị abụọ nwụrụ n'ihi okwu nchekwa sọsọ na Jenụwarị afọ a. Cheta na ndị ụlọomeiwu kpọkwara oku ka onyeisiala gbanwee ndị ọchịagha dị icheiche mana o gebeghi ntị n'okwu a.
[ "Boko Haram", "Naijiria", "National security", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51411610
Ihedioha agaghachịla 'Supreme Court'
Emeka Ihedioha na-ekwu na ọbụ aghụghọ ka Hope Uzodinma ji nweta mmeri n'ụlọikpe kachasị.
2020-02-07T08:51:30Z
Supreme Court Judgement: Ihedioha agaghachịla ịkpegharị ikpe oche ya na Hope Uzodinma
Emeka Ihedioha Emeka Ihedioha agaghachila n'ụlọikpe kachasị ịgwa ha ka ha lebaa anya ọzọ n'ikpe ha kpere nke chuturu ya dịka gọvanọ Imo State. Ihedioha na-ekwu na ọ bụ nghọgbu ka Hope Uzodimma ghọgburu ndị "Supreme Court" mere ha ji kwenye na ọ bụ ya meriri ntuliaka gọvanọ Imo steeti e mere na 2019. Igbo ga-adị n'Anambra steeti Gọọmentị Anambara steeti amachiela ịta ụmụakwụkwọ praịmarị nakwa sekọndịrị ahụhụ maọbụ iri ha iwu maka ịsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ ha. Damian Okeke-Ogene bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo nke Anambara steeti kwuru na atụmatụ ahụ magburu onwe ya ma rịọ ka nkuzi Igbo siwanye ike n'ụlọakwụkwọ dị icheiche. Iwu a metụtara ụlọakwụkwọ pramarị nakwa ndị sekọndrị niile dị na steeti ahụ. Na mba ofesi, Onye dọkịta mbụ buru ụzọ gbaa ama maka ọrịa cọrọnavirus na mba Chaịna alaala mmụọ dịka o butekwara ya bụ ọrịa. Dọkịta a aha ya bụ Li Wenliang gbara ama ọrịa coronavirus n'ọnwa Disemba 2019 mana ndị uweojii mba ahụ sị ya mechie ọnụ na ọ maghị ihe ọ na-ekwu. N'egwuregwu, Otu egwu bọọlụ Real Madrid nakwa Barcelona akwarala laa n'asọmpi Copa Del Rey dịka e mriri ha abụọ n'abalị Tọzde. Real Sociedad ji ọkpụ goolu anọ asatara atọ merie Madrid ebe Athletico Bilbao ji otu ọkpụ goolu gbalaa ndị Barca. Gee akụkọ ụwa n'ime otu nkeji ebe a
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51411612
INEC e nwere ikike imechi otu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa?
INEC mechiri otu ndọrọndọrọ ọchịchị 74 bụ ndị ha sị na ha azọtaghị ọkwa ọbụla na ntuliaka gara aga.
2020-02-07T10:22:57Z
Nigerian Political Parties: INEC e nwere ikike imechi otu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa?
Mahmoud Yakubu Onyeisi INEC bụ Mahmood Yakubu Ọtụtụ ndị mmadụ kpụ ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) n'ọnụ maka ịkachapụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche n'akwụkwọ ha. Ọ bụ n'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị Tọzde ka onyeisi INEC bụ Mahmood Yakubu nọrọ kwupụta na Pati nọ na Naịjiria ga-abụzị naanị 18. Mana nke a edochaghị ndị mmadụ anya nke mere ọtụtụ ji ajụ ma INEC e nwere ikike ịkachapụ aha pati ọbụla. INEC adọtịala ntuliaka Nigeria Inec akwadola ọnọdụ 119,973 maka ntuliaka 2019 INEC kwenyere n'igwe 'card reader' Na oge mbụ, iwu obodo Naịjirịa enyeghị INEC ikike ịkachapụ aha pati ọbụla. Mana n'ọnwa Julaị nke afọ 2017, ndị ụlọomeiwu ukwu megharịrị iwu Naịjirịa nke ugboro anọ nke bekee kpọrọ 'fourth alteration'. N'ebe ahụ ka ha nyere INEC ikike ịkagbu otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị na-emezughi ihe dị iche iwu kwuru. Gịnị ka iwu kwuru? Iwu ahụ kwuru na INEC nwere ike ịkachapụ aha pati ọbụla: dara iwu e nyere ha tupu edebenaye aha ha na-emerighi ọbụladị pasentị 25 nke vootu niile a tụrụ n'otu steeti na ntuliaka ọkwa onyeisiala na-emerighi ọbụladị pasentị 25 nke vootu niile a tụrụ n'otu okpuru ọchịchị na ntuliaka ọkwa gọvanọ na-emerighi ọbụladị otu 'ward' na ntuliaka onyeisioche okpuru ọchịchị na-emerighi ọbụladị otu oche n'ụlọomeiwu nke steeti maọbụ nke etiti na-emerighi ọbụladị otu oche 'councillor' n'otu okpuru ọchịchị. Ọ bụkwa ihe ndị a ka INEC kwuru mere ha ji kachapụ aha pati 74 ahụ. Otu n'ime pati ndị ahụ bụ Action Peoples Party (APP) agaala ụlọikpe iji gbochie nkachapụ aha ha. Gịnị ka pati ndị a kachapụrụ na-ekwu? Tope Fasua bụ onyeisi pati ANRP Tope Fasua, onyeisi pati 'Abundant Nigeria Renewal Party' (ANRP) kwuru na ihe INEC mere adabaghị adaba. Fasua sokwa zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka gara aga. O kwuru na INEC kpọrọ ha n'ọnwa Dịsemba 2019 ka ha gosi ihe niile gosiri na pati ha zuru oke. "Anyị gosiri ndị isioche anyị na steeti dị icheiche, gosi akwụkwọ ọbaego anyị, gosi akwụkwọ ndị otu anyị, gosi akwụkwọ anyị ji kwụọ ụgwọ ụlọọrụ anyị, gosi ihe niile." "Obi tọrọ anyị ụtọ makana anyị chere na anyị etozuola oke dịka iwu INEC si dị." Fasua kwuru na ha ga-aga ụlọikpe ịgbagha ihe ahụ INEC mere. Chekwas Okorie bụ onyeisi pati UPP N'aka nke ọzọ, Chekwas Okorie, onyisi otu United Progressive Party (UPP) gwara ndị ntaakụkọ Punch na ha ahụbeghị akwụkwọ ndị INEC iji gosi na a kachapụla aha pati ha. O kwuru na ha ga-ama ihe ha ga eme ma ha nweta ozi ndị INEC nke ọma. Ka ọ kwụ ugbua, ọtụtụ patị ndị a ekwuola na ha ga-agba Inec akwụkwọ n'ụlọikpe maka atụmatụ a.
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51410891
Ụzọ ndị ụlọakwụkwọ sị ata ụmụaka ahụhụ ma ha sụọ Igbo
Gọọmentị Anambra steeti amanyela iwu ga-akwụsị ịta ụmụ akwụkwọ ahụhụ maka ịsụ asụsụ Igbo.
2020-02-07T14:00:41Z
Igbo Language: Ụzọ ndị ụlọ akwụkwọ sị ata ụmụaka ahụhụ ma ha sụọ Igbo
Ụmụaka na-agụ akwụkwọ Gọọmentị Anambra steeti amanyela iwu gbochiri ụlọa kwụkwọ na steeti ahụ ịta ụmụakwụkwọ ahụhụ maka ịsụ asụsụ Igbo. Ha kwuru na o megidere iwu ji steeti ahụ ịtya nwata ọbụla ahụahụ maọbụ ịda ha nha ma ha sụọ Igbo n'ụlọ akwụkwọ. Ihe gị na ụmụ gị nwere ike ịme n'oge ezumike Ụmụaka Igbo eturula ugo ọkaibe na teknụzụ na mbaụwa Dịka ọ dị ugbua amaghị ma mmachị a ọ gụnyere Mahadum mana ọ bụ n'ụlọ akwụkwọ pramarị na sekọndrị ka ihe a kachasị eme. O nwere ụfọdụ ụzọ ndị ụlọ akwụkwọ si akwụsị ụmụaka ị sụ asụsụ Igbo nke ụfọdụ che na ọ bụ ihe Bekee na-akpọ 'Vernacular' n'ime ụlọ akwụkwọ. Ha na-ada anyị nha Chukwuname Obiejesi bụ onye ntaakụkọ BBC gụrụ akụkwọ nỌwụwa Anyanwụ Naịjirịa kọwara na mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ praịmarị, a na-ada ha nha "A na-edetu aha ndị sụrụ Igbo ma napụta ha naịra iri na ngwụcha ụbọchị" ka o kwuru. Ịma njakịrị Kelechi Agbanelo kwuru na ya na onwe ya ahụghị iwụ ọbụla machiri ịsụ asụsụ Igbo mgbe ọ gụrụ akwụkwọ. "E nweghi iwu pụrụiche megidere ị sụ Igbo mgbe ahụ mana ụmụakwụkwọ ị be gị ga na-amasa gị njakịrị" ka o kwuru. Ị ta ahụhụ Onye ọzọ anyị jụrụ ajụjụ bụ Chimezie Ucheagbo kwenyere n'ihe Maazi Agbanelo kwuru. O kwuru na a na-ata ha ahụhụ ndị dịka ịsị ha sekpuru ala maọbụ bara ha mba. Damian Okeke-Ogene bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo nke Anambara steeti kwuru na atụmatụ ahụ magburu onwe ya ma rịọ ka nkuzi Igbo siwanye ike n'ụlọakwụkwọ dị icheiche. O kwuru na ụlọakwụkwọ dị icheiche kwesiri ịtinye aka ka awụlite asụsụ Igbo kama ị na-akwụsị ya. Ọ fọziri ị ma ma steeti ndị ọzọ n'ala Igbo a ga-eṅomi atụmatụ a. Na Legọs steeti, ọ bụzi iwu na onye ọbụla chọrọ ka ọ gụọ mahadum ga amarịrị ịsụ Yoruba.
[ "Asụsụ", "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51406968
'Nyochakwaa 'genotype' tupu ị lụọ onye ọbụla ị chọrọ ịlụ' - Eucharia Anunobi
Eucharia Anunobi bụ otu onye a na-asị 'unu abịala' na Nollywood kwuru maka ihe ndị gbasara ndụ ya.
2020-02-07T17:48:07Z
Eucharia Anunobi: Ọnwụ nwa ya, ijere Chukwu ozi na ihe ndị ọzọ gbasara ndụ ya ị maghị
Eucharia Anunobi Eucharia Anunobi bụ 'odogwu' n'ihe gbasara ime ejije na Nollywood nyere BBC Igbo ohere ibanye na ndụ ya. Site na nkata ya na BBC Igbo kpara n'ihe nkiri 'Gịnị na-afịọ', ọ kọwara maka ọnwụ nwa ya, etu o si gbabuo ọsọ ịgara Chukwu ozi, etu o si ka na-eme ejije n'agbanyeghị na ọ bụ ụkọchukwu, nakwa ihe ndị ọzọ. N'ọnwụ nwa ya nwoke nwụrụ n'afọ 2017 ka ọ dị naanị afọ 15, o kwuru sị "Nwa m bụ SS ma na ọ bụghị ya gburu ya, ọ bụ mmeghie ndị ụlọọgwụ". "E tinyerem ezigbote ego n'ahụ nwa m tupu ọ nwụọ." Ọ gara n'ihu dụọ ndị mụtara ụmụ nwere ọrịa nwa ya rịara bụ 'sickle cell disease' (SS) nke a na-akpọ ọrịa ọbara nko n'Igbo. Na ndụmọdụ ya o kwuru sị "Onye nwa ya bụ SS, a ga na-agba mbọ inye ya ezigbote nri." Nri ndị a ga-enyere ndị na-arịa 'Sickle Cell' aka Kedu ihe bụ ọrịa ọbara nko? O kwukwara sị "Ị bụrụ nwaanyi ị bụru nwoke, mmadụ sị gị bịa ka m lụo gị, nyochakwa ihe Bekee n'akpọ genotype." Ihe ndị ọzọ o kwuru: Maka etu o si malite ijere Chukwu ozi, ọ sị "Nna m gbara mbọ hụ na anyi gụsiri akwụkwọ ike. Agụrụ m akwụkwọ dị iche iche. "A gụrụ akwụkwọ nsọ ka m hụ ebe o dere na ndị kwesiri ị na-akpagbu ụmụ ya. "Etu a ka akwụkwọ nsọ na ọbara Chineke siri banye anyị n'ime. "Ọ bụ otu ọyị m nwaanyi kpọ m gaa ụlọụka n'Abụja. "Agara m ọtụtụ ụka were hụ na ihe gbasara chukwu na-atọ m ụtọ." "Agbara m ọsọ oku Chineke nọ na-akpọ m, mana e mechara m bịaghachị, e tee m mmanụ nsọ n'afọ 2012, m wee bido ijere Chukwu ozi". "Ka m mere Glamour Girls nke abuọ m ọ bịa wuo ebe niile m were sị na m soro etu esi eto m, m ga-efu ụzọ. Eucharia kwukwara na ọ ka na-eme ejije; o kwuru na nke o mere nso nso a bụ nke a kpọrọ "small chops". Gere ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju n'elu: Akụkọ ndị a ga-amasị gị: Anyị na ndị uweojii ekpebibeghi - Ezinaụlọ Chima Ikwunado Ndị Igbo anọ si na mmegbu ghọrọ ndị ọchịchị Ụzọ ndị ụlọakwụkwọ sị ata ụmụaka ahụhụ ma ha sụọ Igbo
[ "Nollywood", "Ihe nkiri", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51400950
Anyị na ndị uweojii ekpebibeghi - Ezinaụlọ Chima Ikwunado
Ezinaụlọ Chima Ikwunado onye a sị nwụrụ n'aka ndị uweojii sị na ha na ndị uweojii enwebeghi mkpebi ọbụla maka ọnwụ ya.
2020-02-07T19:03:16Z
Justice for Chima: Anyị na ndị uweojii ekpebibeghi - Ezinaụlọ Chima Ikwunado
Chima Ikwunado Chima Ikwunado nwụrụ n'ebe ndị uweojii jichiri ya Ezinaụlọ Chima Ikwunado bụ nwoke a na-ekwu nwụrụ n'aka ndị uweojii na Pọtakọt ekwuola na ha na ndị uweojii ekpebibeghi ihe ọbụla. Nke a na-abịa ka ndị mmadụ na-eche ihe ha na onyeisi ndị uweojii nke Rivas steeti bụ Mustapha Dandaura, kpara. 'Autopsy' kwuru na ọ bụ ọrịa shuga gburu Chima - Ndị uweojii #EndSARS: Mgbanwe ọ bịala na ngalaba uweojii a? A chụọla onye uweojii SARS maka ịna akaazụ N5,000 Obinna Ezirim bụ nwanne Chima gwara BBC na Dandaura kpọrọ ezinaụlọ ha oku ka ha kpaa dịka okwu na-efegharị na ndị uweojii kpọrọ ha oku ha ajụ ịza nakwa na ezinaụlọ ha kwuru na ha degara akwụkwọ na ha chọrọ ịhụ ya mana o nweghi isi. Ezinaụlọ Chima Ikwunado Obinna kwuru na ha na ndị uweojii kpebiri ịhụ ozu Chima nke ka dị n'aka ndị uweojii nakwa nke a ga-eme nyocha na Mọnde nke izu na-abịa. "Kọmishọna uweojii sị anyị kpọta onye nnyocha nke anyị ụbọchị Mọnde, hanwa ga-akpọtakwa onye nke ha, e mezie nnyocha ahụ. "Kọmishọna kwukwara na ọ di mma etu ezinaụlọ Chima si bịa, mana gọọmentị ga-elebarịrị anya na ya." Ọrịa Coronavirus Dkt. Li tinyere foto ebe ọ nọ n'elu akwa na soshal midia Ọzọ bụ iwe ndị mmadụ na mba Chaịna maka etu ọrịa coronavirus si gbuo Li W bụ dọkịta bu ụzọ kwuputa maka ya na Disemba. Ọtụtụ n'ime ha na-asị ka gọọmentị rịọ mgbaghara maka iji ndị uweojii gbọchie Li ọnụ, nke mere ka ọrịa a bụrụ ibu na-anyị danda ugbua. N'egwuregwu, Raheem Sterling si Liverpool gafee Manchester City n'afọ 2015 Raheem Sterling nke Manchester City agaghị eso ha gbaa bọọlụ n'ime izuụka ole na ole na-abịa dịka ọ dọwachara akwara ụkwụ ya. Ebe Daley Blind ga-alọghachịta ma soro ndị Ajax gbaa bọọlụ n'ụbọchị Satọde, ka a chọpụtachara na o nwere ọrịa obi. 'Supreme Court' sị Jolly Nyame gaa zuo ike afọ 12 na nga Jolly Tavoro Nyame chịrị steeti Taraba na Naịjirịa site afọ 1999 ruo 2007 Ụlọikpe kachasị ekpebiela sị ka Jolly Nyame bụ aka chịburu Platu steeti ka nọrọ na mkpọrọ ruo afọ iri na abụọ a tụkpuburu ya. Ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission gbara ama mkpebi ụlọikpe n'akara Twitter ha. Ebubo EFCC boro Nyame bụ na aka ya dị n'otu ijeri naịra na ọma e mefuru n'aka Taraba steeti oge ọ na-achị steeti ahụ. Ndị ọkaiwu ise nke Mary Odili nọ n'isi ya, kachapụrụ nha ụlọikpe mkpegharị sị ka Nyame kwụọ. Ọ bụ n'afọ 2007 ka ikpe a malitere. Anyị arụghị ụlọekpere ndị alakụba - Gọọmentị Enugwu Kọmisọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Enugwu steeti bụ Nnanyelugo Aroh ekwuola na o nweghi oge gọọmentị ha jiri hibe ụlọekpere maka ndị Alakụba. Maazị Aroh sị na ọ bụ ndị asịrị na-ekesa ya bụ akụkọ ma kwukwa na ọ bụ arụrụala kpatara ha ji akpa ụdịrị agwa ahụ. Ọ sị na akụkọ a bụ iji megide ọrụ gọọmentị Enugwu steeti na-arụ. Uzodinma so Buhari aga Njem Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-aga mba Etiopia taa bụ Febrụwarị 7 2020, maka ọgbakọ ndị mba Afịrịka na-aga n'ihu n'isiobodo mba ahụ bụ Adis Ababa. Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma ga-eso Buhari na njem ga-abụ mbụ o so ya aga kemgbe Ụlọikpe Ukwu nyere ya ọkwa gọvanọ Imo. Ị chọrọ ịza ogbu enyi? Ndị mmadụ na-ahụta enyi dịka eze ụmụanụ niile Mba Botswana na-enye ndị mmadụ ikike igbu enyi narị abụọ n'afọ 2020. Mana, ya bụ ikike abụghị n'efu dịka ọ bụ puku dọla iri na asatọ ka e ji enweta otu. A ahọpụtala ndị enwereike ịtụugo na AMVCA Ndị na-eme ejije n'Afịrịka na-ahazi onwe ha maka emume ntụrụugo akpọrọ African Magic Viewers Choice Awards. Ọtụtụ n'ime ha na-enwe nchekwube na ha ga-etụta ugo maka mbọ ha gbara n'ejije ihe nkiri dị iche iche n'afọ gara aga.
[ "Enugu Steeti", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51421110
Ihe ndị mere ka izu a bụrụ daachịị
Izuụka a nwere ihe ndị dị iche iche mere n'ime ya nke mere o ji pụọ iche n'izuụka ndị ọzọ.
2020-02-08T05:23:24Z
Donald Trump, Fada Ejike Mbaka, uwe ọhụrụ ndị Super Eagles na ihe ndị ọzọ wuru n'izu a
Fada Mbaka, Donald Trump na Uwe ọhụrụ ndị Naịjirịa Izuụka a malitere n'ụbọchị abụọ ma kwụsị n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020, nwere ihe e ji kpọọ ya 'ọpụrụiche'. Ihe mere na ị gaghị echefu izuụka a ọsịsọ Lee ihe mere izuụka a ji bụrụ 'Sekem' Wizkid,Orji Uzo Kalu na Cardi-B so na ndị wuru ewu n'izu a Ihe ndị mere na ya bụ izu gụnyere akụkọ ndọrọndọrọ, egwuregwu, ịkpaọchị dgz, na Naịjirịa nakwa ụwa niile gbaa gburugburu. Ụfọdụ akụkọ ndị a gụnyere; Emeka Ihedioha na Fada Ejike Mbaka N'izuụka a, BBC Igbo gbara Emeka Ihedioha ajụjụ banyere ihe mere o ji alaghachị n'ụlọikpe kachasị kamgbe ha chụturu ya dịka gọvanọ Imo Steeti. Na nzaghachi, Ihedioha sị na ọ bụ n'ihi na ya na ndị ọkaiwu ya chọpụtara na ikpe ahụ ụlọikpe a kpere edochaghị anya. Tinyekwara na ha nwere ohere ịlaghachị azụ ka ụlọikpe tulegharịa ikpe ahụ. Mkparịtaụka a butere ọtụtụ okwu na soshal midia. Na nke yiri ibe ya, ụkọchụkwụ 'Adoration Ministry Enugwu' bụ Fada Ejike Mbaka kwuru ihe wuru ewu n'izu a. O kwuru na ọ bụrụ na Ihedioha akapcharaghị anya, na ọ ga-aga mkpọrọ n'ihi etu o si achụso ikpe nchụtu ya. Amalitela ịna 7.5% VAT maka oku na ozi ekwentị N'izuụka a ka ụlọorụ ekwentị kwuputara na ha ga-amalite ịna pasentị asaa na ụma ise dịka ụtụisi ịkpọ oku nakwa izipu ozi n'ekwentị. Ọ malitere iwu na soshal midia Twitter, ebe ọtụtụ ndị mmadụ gbarụrụ ihu na-ekwu na nke a gosiri n'ihe na-esiwanye ike na Naịjirịa. Iji maa atụ, ozi 'sms' a na-anabu naịra anọ bụzị naịra anọ na kobo iri ugbua n'ihi VAT. Cheta na onyeisiala Buhari binyere aka n'iwu a kpọrọ 'Finance Act' n'ọnwa Jenụwarị. Iwu ahụ kwuru na a ga-ebuli ụtụisi 'Value Added Tax' (VAT) site na pasentị ise ruo pasentị asaa na ụma ise. Aka Donald Trump dị ọcha N'ụbọchị Wenezde nke izu a, ndịomeiwu mba Amerịka mere ntuliaka ma kwuo na aka onyeisiala ha bụ Donald Trump dị ọcha n'ebubo abụọ e boro ya. Ndị ụlọomeiwu nta mba Amerịka boro Trump ebubo na ọ na-emebi ikike ọchichị ya nakwa ụlọomeiwu n'ọnwa Disemba 2019. Ihe mere Trump ji ewusi ike na Naịjirịa Mana ndị Sịnetị kụchapụrụ ebubo ndị a ma kwuo na o nweghi iwu ọbụla Trump dara. Nke a mere ya onyeisiala mba Amerịka nke atọ e boro ebubo nchutu n'ọchịchị. Pati nọ na Naịjiria ga-abụzị naanị 18 N'ụbọchị Tọzde n'izu a ka onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu weturu ọnụọgụgụ pati nọ Naịjirịa site n'iri itoolu ruo iri na asatọ. Nke a mere oke mkpọtụ na Naịjirịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ kpụ ụlọọrụ Inec n'ọnụ. INEC e nwere ikike imechi otu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa? Mmachi keke na ọgbatumtum na Legọs N'ụbọchị Monde izu a, ndịọrụ Bekee na ndịọrụ dị icheiche bi na Legọs takutere ya kọnkịrị dịka ha na-aga ọrụ ka e zuchara ike ngwụcha izu. Etu anyị si taa ahụhụ ịga ọrụ taa - Ndị Legọs Nke a bụ maka mmachi gọọmentị steeti ahụ machiri keke na okada nke malitere n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Febụwarị afọ 2020. Ngwa ka anyị nabata gị n'ọgbọ egwuregwu na obi aṅụrị ebe a; Abụ m nwaafọ Naịjirịa - Lil Wayne N'otu izu a ka nwaafọ Amerịka na-eti egwu bụ Lil Wayne kwupụtara na ọ bụ nwaafọ Naịjirịa nke butekwara ọtụtụ okwu n'etiti ndị Naịjirịa. Mgbe ọ na-aza ajụjụ ọnụ, Lil Wayne sị na o mere nyocha ahụ ma chọpụta na o ji pasentị 53 bụrụ nwaafọ Naịjirịa. O kwuru na ya na nne ya nwere ezigbo mkparịtaụka gbasara nke ahụ. Uwe bọọlụ ohụrụ nke Naịjirịa N'ụbọchị ise nke ọnwa Febụwarị a ka otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa bụ Nigeria Football Federation(NFF) wepụtara uwe ọhụrụ a ga na-eji agba bọọlụ. Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa katọrọ uwe a ma kwuo na nke a bụ mkparị nye Naịjirịa ebe ndị ọzọ katọrọ ndị e ji gosi uwe a. Ị lezie anya ị ga-ahụ na akụkọ ndị a na ndị ọzọ na-anọghị ebe a mere ka izuụka a bụrụ 'ọpụrụiche' na nke onwe ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị Igbo anọ si na mmegbu ghọrọ ndị ọchịchị 'Nyochakwaa 'genotype' tupu ị lụọ onye ọbụla ị chọrọ ịlụ' - Eucharia Anunobi Ụzọ ndị ụlọakwụkwọ sị ata ụmụaka ahụhụ ma ha sụọ Igbo
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Donald Trump", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Amerika", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Abụ", "Imo steeti", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-51425002
Kọntena esila n'elu dagide otu nwaanyị na Legọs
Otu nwaanyị ji anya ya hụ ntị ya taa ka kọntena trailer si n'elu akwa dapụ ma dagide ya na Legọs.
2020-02-08T16:39:39Z
Iyana Ipaja: Kọntena si n'elu daa akwọjipula nwaanyị ụkwụ na Legọs
Trailer si n'elu dapụ Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na nwaanyị aha a na-amabeghị aha ya na-azọ ndụ ya n'ụlọọgwụ ka kọntena ahụ dagidere ya kwọjipuru ya otu ụkwụ. Ndị ụlọorụ gbatagbata Lagos State Emergency Management Agency (Lasema) agaruola Iyana Ipaja bụ ebe ihe a mere, ịma etu ha ga-esi nyere aka. Aisha Buhari gara ileta ndị ụlọ dakwasịrị Ụlọ elu adagbuola Injinịa na-arụ ya n'Onitsha Ụlọ ọzọ adaala merụọ mmadụ anọ ahụ na Legọs Ka ọ dị ugbua, onyeisi ha bụ Olufemi Damilola Oke-Osanyintolu sị na a kpọgala ya ụlọọgwụ, ma kwukwaa na ha na-agba mbọ ịwepụta ụkwụ nwaanyị ahụ n'okpuru kọntena ahụ nakwa wepụ kọntena ahụ n'ụzọ. Anyị ga-ebu ọnụ otu izu maka ọkwa Ihedioha - PDP Imo steeti Ndị otu pati PDP nke Imo steeti na-akwado ibu ọnụ na ime ekpere otu izu bido ụbọchị ụka a bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa a ruo ụbọchị iri na isii. N'akwụkwọ odeakwụkwọ pati ha bụ Nze Ray Emeana zipụrụ, o kwuru na ekpere a bụ ịrịọ Chineke ka o nyere aka mee ka Emeka Ihedioha nwetekwa oche ya dịka gọvanọ Imo steeti. Ihedioha agaghachịla 'Supreme Court' 'Ọ bụ PDP ka ọ dịrị ịsa Mbaka okwu' - Onye mgbasaozi Ihedioha "Ihedioha kwado ịga mkpọrọ" - Fada Mbaka Ha sịkwa ka ndị mmadụ yiri akwa ojii kwa ụbọchị ekpere a. Cheta na Ihedioha agaghachịla ụlọikpe kachasị ịma ma o nwere etu ọ ga-esi weghachịtakwa oche o si na ya pụọ. Ighalo agaghị eso Man Utd gaa Spen Odion Ighalo agaghị eso Manchester United gaa ọgbọ nkwado ha chọrọ ịga na mba Spen maka ụjọ coronavirus. Ole Gunnar Solskjaer bụ onye nchịkọta otu egwuregwu ahụ sị na ha achọghị ọnọdụ ọ ga-abụ na ha gaa, agaghị ekwe ya banyeghachị na Briten maka etu a ọ ka si Chaịna bịa n'izu gara aga. Onye agha ewerela egbe baa obodo gbagbuo ihe ruru mmadụ 20 E jidebeghi Jakraphanth Thomma bu onye a na-eche na ọ bụ ya kpara ike a Akụkọ si Taịland apụta na-akọwa na otu onye agha ji egbe gbagbuo mmadụ iri abụọ (20) ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ n'obodo Korat dị nso na Bangkọk. Thomma bu ụzọ gbagbuo onyeisi ya bụ Col Anantharot Krasae, tupu o zuru egbe na ngwaagha ndị ọzọ pụọ. Ihe ndị mmadụ na-etinye na soshal midia na-egosi na ọ gara n'ụlọahịa ebe ọ nọ na-agwụ ndị mmadụ. Dịka ndị uweojii siri kwuo, onye agha a zuru ụgbọala n'ọdọ ndịagha tupu o jiri egbe wakpoo ndị mmadụ na ya bụ obodo. O tinyekwara ihe onyonyo ebe ọ na-akwọ ụgbọala ahụ n'elu Facebook ya. Ka ọ dị ugbua, a ka na-achọ ijide ya dịka e zipuru ozi "onye a bụ onye a na-achọsi ike" maka ya. Ọzọdịmgba anọ anwụọla Ọzọdịmgba a na-ahụ naanị n'ugwu ji naanị obere ihe gafee otu puku fọrọ n'ụwa Amụma igwe esegbuola ọzọdịmgba anọ gụnyere otu nke dị ime na mba Uganda. Ngalaba na-ahụ maka nlekọta ha bụ Greater Virunga Transboundary Collaboration (GVTC), kwuru na nke a dị mwute n'ihi na ụdịrị ọzọdịmgba a na-ahụ naanị n'ugwu ji naanị obere ihe gafee otu puku n'ụwa. 'Anyị achọghị ịhụ ndị ji ọkọrọtọ Biafra n'olili Eze Kanu' - Ndị Uweojii Dịka Olili nne na nne Nnamdi Kanu na-abịa nso, ndị uweojii n'Abịa steeti ekwusiela ike na ha achọghị ihu onye ji ọkọrọtọ Biafra maọbụ uwe ndị 'Jew' n'ebe ahụ. Ene Okon bụ onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ etiela aka n'ala sị na ya agaghị anọ ndụ hụ ka nke ahụ mere dịka otu Ipob na-azọ iwu na ha ga-abịarịrị. N'aka ọzọ, otu ndị ntoroọbịa Ohaneze ndị Igbo arịọla ka gọọmenti gbaghara Nnamdị Kanu ka ọ nwee ike ịbata bịa lie nne ya na nna ya. Nnamdi Kanu na onwe ya tiri mkpu n'elu Twitter na ndịagha Naịjiria na-akwado ịga n'ụlọoriri na nkwari ndị dị n'Ụmụahịa, ka ha nwee ike "ịkpụrụ ndịisi Ipob nwereike ịbata tupu e mee akwamozu" nne na nna ya. Ndị uweojii sị na ọbụghị ogbunigwe Ndị uweojii n'Ekiti steeti ekwuola na ọ bụ ihe eji agbari ogbunigwe gbara na steeti ahụ n'ụtụtụ taata. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Asuquo Amba sị na ọ bụghị ndị omekome mere ihe a mana ha na nyocha ịmata etu o si mee. Coronavirus na Chaịna N'ofesi, Hong Kong etiela iwu ga-eme ka onye ọbụla sị mba Chaina bata obodo ahụ ga nọrọ n'ogige ebe ndị ana enyonyo maka Coronavirus ruo izuụka abụọ. Ya bụ iwu sị ndị mmadụ akwụgharịzịna, maka ịtụ ha mkpọrọ maọbụ iri ha iwu. Lagos City Marathon David Barmasai ga-erite ego dị $50,000 maka meri a N'egwuruegwu, onye mba Kenya bịara Nigeria maburu nturuugo nke mwemwe ọsọ nke Legọs Marathon agbara n'ụtụtụ a David Barmasai Tumo ji awa abụọ, nkeji iri abụọ na tịnkọm tịnkọm isii merie ya bụ ọsọ kilomita iri anọ na abụọ mgbe ọtụtụ ndị ọtụ ya ka nọ n'ụzọ. Ọ bụkwa onye Kenya ọzọ bụ Sharon Cherop tuuru ugo mwemmwe ọsọ nke ụmụnwaanyị. Onye nke abụọ na onye nke atọ na ya bụ ọsọ ga-erita $40,000 nakwa $30,000. Nke a bụ agba nke anọ ya bụ ọsọ malitere n'afọ 2016 bụ nke a na-eme na Legọs. Kemgbe amalitere ya bụ ọsọ, ndị Kenya emeriela ya ugboro atọ ebe onye Etiopia merigoro otu ugboro n'ọsọ nke ụmụnwoke. Na nke ụmụnwaany,i ndị Etiopia emeriela ugboro atọ ebe Kenya ji otu. Trump achụọla ndị iro ya n'ọrụ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump achuọla Alexander Vindman na Gordon Sondland n'ọrụ. Mmadụ abụọ a so n'ime ndị zara okwu Ụlọomeiwu Nta nke Amerịka oge ha na-enyocha nrụrụaka ha boro Trump. Ihe mere Trump ji ewusi ike na Naịjirịa Ọchịagha Vindman na-arụ ọrụ na obi gọọmentị Amerịka ebe Nnọchiteanya Sondaland bụ onye na-ekwuru Amerịka na Yurope. Nke a na-abịa dịka a na-ekwu na Maazị Trump chọrọ ịhazịarị ndị ọrụ ya dịka ndi Omeiwu Ukwu kpebiri na onweghi arụ ọ kpara. Onyeisiala Muhammedu Buharị nọ Ethiopia maka ọgbakọ Ụmụibe Onyeisiala Muhammadu Buhari anwuchiela mba Ethiopia ụnyahụ maka nzụkọ ndị isi mba Africa. Mba iri anọ so eme ya bụ ọgbako ukwu akpọrọ maka ọdịmma ndị Afrịrịka Ego Abacha Ụnyaahụ bụ Fraịde ka ụlọikpe ukwu na Naịjirịa tụghapụrụ arịrịọ ezenaulo na-arịọ ka enye ha ohere ibitu ego otinyere n'ụlọakụ na Briten, Switerzland, Jersey, Liechtenstein nakwa Luxembourg. Gaurdiola sị na anya ya adịghị na Messi Pep Guardiola bụ onye bubu onye nchịkọta otu Bayern Munich N'egwuruegwu, Pep Gaurdiola nke Manchester City ekwuola na ya anaghị atụanya Lionel Messi isonyere ya na otuegwuruegwu ya. Messi na otu onyeisi ha bụ Eric Abidal na-enwe nghọtahie na Barcalona nke ndị mmadụ na-atụ anya na o nwere ike ịpu na otu ahụ. Nkeji Akụkọ ga-amasị gị Anyị na ndị uweojii ekpebibeghi - Ezinaụlọ Chima Ikwunado INEC e nwere ikike imechi otu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa? Buhari ka na-ekwukwa na ya 'meriri' Boko Haram
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Donald Trump", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51372246
Ọkụ ngaji n'eze, lee ụzọ 9 ị ga-esi rie osikapa ka ọ tụ gị n'ọnụ
Osikapa bụ otu nri ndị Naịjirịa anaghị eji egwu egwu, nke mere na ike ekwesịghị ịgwụ gị ma ị jiri ụzọ dị iche iche rie ya.
2020-02-09T05:06:18Z
Nigerian foods: Ọkụ ngaji n'eze, lee ụzọ dị iche ị nwereike isi eri osikapa gị
Osikapa dị iche iche Ọtụtụ ndị mmadụ nwereike iluso gị ọgụ ma ị kparịa osikapa n'ihi etu o si amasị ha iri ya. Osikapa bụ otu nri ọ na-abụ ego kọgodu gị elu kọọ gị ala, e nwee etu i si hụ obere ego jiri gote ya, ị ga-atụkwasịnwu ya ihe ọbụla were rie ya. N'ihi etu o si amasị ndị mmadụ, a chọpụtala ọtụtụ ụzọ dị iche iche e si esi nakwa eri ya bụ nri ọ dị mma n'ọnụ, n'afọ nakwa n'anya. Etu ndị Igbo si bido riwe osikapa n'ụbọchị ụka Lee nri ndị e jiri chere ndụ n'oge agha Biafra, ụfọdụ ka a ka na-eri ugbua 'Ọ bụ osikapa mba Ghana e nyere m sie wụrụ m n'ala' Ụfọdụ ụzọ e si eri osikapa gụnyere ịsụ ya asụ dịka ndị Ugwu Awụsa si eme nke a kpọrọ 'tuwo shịnkafa" nakwa Sịnasịr (ha na-eghe ya eghe ma a kwọchaa ya), ndị Yoroba na-esi nke ha na-akpọ osikapa ọfada, ndị ọcha na-eji nke ha eme ihe a kpọrọ 'pudding', nke bụ osikapa e siri esi dere ede ma wụnye mmiri ara ehi na shuga ma sikọta ya n'ite ka akamụ. Ụfọdụ ihe mere e ji na-eri osikapa bụ makana ọ na-eju afọ, ọzọ bụkwa na ọ bụ nri i nwereike isi o zuoro ọha. Ụzọ dị iche iche i nwereike iji sie ya Osikapa Jọlọf Ị mewela emume ma ọ bụrụ na ị buputebeghị osikapa jọlọf n'emume gị? Nri a so n'ihe mere ụfọdụ ndị mmadụ ji ekwe aga emume, n'ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ndị mmadụ na-ejikarị nkụ esi ya; mere ka a na-akpọ ya 'party jollof' na Bekee. Ihe e ji esi ya gụnyere: nnu, ose, tomanto, mmanụ ọpụpa, mmiri anụ, anụ maọbụ azụ, yabasị, ngwanri na-eme ka nri tụ n'ọnụ dịka taịm na kọrị, osikapa e siri sọsọ ya. Ụfọdụ na-aga n'ihu tinye ya ihe dị ka karọt, ose na-atọ ụtọ, agwa ndụ ndụ wdgz. Etu ị ga-esi sie ya: Situ osikapa gị n'ọkụ mana ekwela ya ghee eghe tupu i fọtuo ya n'ọkụ. Wụpụ mmiri dị na ya. Ghee stu gị n'ite ọzọ, (ị ga-eji mmanụ ọpụpa, tomanto, nnu na ose na yabasị na ngwa nri ndị ọzọ eghe ya) tinye ya mmiri anụ gị Hapụ ha ka ha sụkọta ọnụ. Wụnye osikapa gị n'ime ya; gbado anya ka ị ghara ịwụbọ ya mmiri. Kpuchie ite gị ma gbadaa ọkụ i ji esi ya obere. Hapụzie ya ka o ghee nakwa ka mmiri ahụ takpọọ Ụfọdụ na-etinye nnu ha mgbe ha wụnyechara mmiri anụ. Osikapa e ghere eghe Ị bụ onye Naịjirịa ma ọ bụrụ na ị maghị na osikapa e ghere eghe na nke jọlọf na-azọ 'nwunye di'? Ọ bụkwa nri ọzọ a na-ahụ ma e mewe emume na Naịjirịa; ọ bụ agbamakwụkwọ o, ikupute nwa, maọbụ akwamozu. A na-eri ya ọsịsọ makana a hapụ ya ka o tee aka, ọ na-agbakarị ụka ọsịsọ ụfọdụ oge. Ihe e ji esi ya gụnyere: nnu, ose, mmanụ ọpụpa, mmiri anụ, yabasị, ngwanri na-eme ka nri tụ n'ọnụ dịka taịm na kọrị, osikapa e siri sọsọ ya, anụ maọbụ azụ. Karọt na ose na-atọ ụtọ e biri ebi, agwa ndụ ndụ, kọrị na-adịrịrị ya; a na-etinyekwa ya ọka dị ụtọ, umeji anụ e biri ebi ma sie n'ọkụ, wdgz. Etu ị ga-esi sie ya: Situ osikapa gị n'ọkụ mana ekwela ya ghee eghe tupu i fọtuo ya n'ọkụ. Wụpụ mmiri dị na ya. Were mmanụ ọpụpa ghekọlata karọt, ose na-atọ ụtọ, kọrị na ihe ndị ọzọ ahụ i biri ebi gụnyekwara yabasị Wụnye mmiri anụ n'ime ite osikapa ahụ i situru esitu; hapụ ha ka ha sụkọta ọnụ Etinyekwala nnukwu mmiri n'ime ya ka ọ ghara ịgwọ agwọ Kpuchie ite gị ma gbadaa ọkụ i ji esi ya obere. O situ obere, wụnye ya ihe ndị ahụ i ghere eghe Hapụzie ya ka o ghee nakwa ka mmiri ahụ takpọọ Osikapa na stu tomanto Nke a mechara bụrụ ihe a na-akpọ 'osikapa ụbọchị ụka' maka etu e si esikarị ya ụbọchị ụka. Tupu ụwa asaa anya etu ọ dị ugbua, ọ rara ahụ ịhụ ezinaụlọ ọ ga-abụ ị garuo ị hapụ ịhụ osikapa na stu tomanto ụbọchị ụka. Ọ naghị ara ahụ isi ma ncha. Ọ naghị egbukwanụ oge. Ihe e ji esi ya gụnyere: nnu, ose, mmanụ ọpụpa, mmiri anụ, yabasị, ngwanri na-eme ka nri tụ n'ọnụ dịka taịm na kọrị, osikapa e siri sọsọ ya, anụ maọbụ azụ. Etu ị ga-esi sie ya: Sie osikapa gị ka o ghee eghe, mana etinyekwala ya ihe ọbụla (ụfọdụ na-eji nnu esi ya) Were mmanụ ọpụpa, tomanto, nnu na ose na yabasị na ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tọọ ụtọ ghee ya. Tinye ya mmiri anụ ma tomanto gị kpọtụ akpọ Osikapa na ofeakwụ Nke a bụ otu nri ndị Igbo anaghị eji egwu egwu ma ncha. O so na nri ndị Igbo bi na mba na-eji ama na ha alọtala ma ha tinyehaala ya n'ọnụ. Ihe e ji esi ya gụnyere: nnu, ose, mkpụrụ nkwụ, mmiri anụ/azụ, yabasị, nchanwụ, ịsha, ngwanri na-eme ka nri tụ n'ọnụ, osikapa e siri sọsọ ya, anụ maọbụ azụ. Etu ị ga-esi sie ya: Sie osikapa gị ka o ghee eghe, mana etinyekwala ya ihe ọbụla (ụfọdụ na-eji nnu esi ya) Sie ma sụọ mkpụrụ nkwụ gị mgbe o ghere, pịpụta mmiri na mmanụ n'azụ ya ma tinye ya bụ mmiri na mmanụ ị pịpụtara n'ite, tinyekwa ya mmiri anụ/azụ ka ha sụkọta ọnụ Tinye ya ngwa nri ndị ahụ i kwadoro (nke e dere n'elu) ma ose ma nnu, kpuchie ya Chere ka ọ rọtu arọ; nke a mee i tinye ya nchanwụ ma gbadaa ọkụ Hapụtụ ya obere tupu i butuo ya Osikapa na stu 'curry' Nke a bụ nke a mụtara n'aka ndị mba ofesi mana ndị Naịjirịa na-esite ma na-erite ya ọnụ ha ugbua. Ọ na-atọwa ntị ma i rie nke onye ma esi siri. E nwereike ịkpọ nke a nri 'di m ji ego' n'ihi ụdịrị ihe ndị e ji esi ya. Ihe e ji esi ya gụnyere: nnu, ose, mmanụ ọpụpa, mmiri anụ, yabasị, ngwanri na-eme ka nri tụ n'ọnụ dịka taịm na kọrị, osikapa e siri sọsọ ya, anụ maọbụ azụ. Ụfọdụ na-etinyekwa karọt, ose na-atọ ụtọ, kabeeji nakwa akwụkwọ nri ndị ọzọ. Etu ị ga-esi sie ya: Sie osikapa gị ka o ghee eghe, mana etinyekwala ya ihe ọbụla (ụfọdụ na-eji nnu esi ya) Sie anụ (tinye ya kọrị, galiki, taịm, jinja, nnu) Were obere mmanụ ọpụpa ghekọlata yabasị na karọt na ụmụnne ya (gbadaa ọkụ) Ụfọdụ na-etinye flọọ ka o nwee ike rọọ arọ Wụkọta ihe ị ghere eghe na anụ ahụ i siri ma kpuchie ya ka ọ sụkọta (gbadaa ọkụ gị ọfụma) Osikapa mmanụ ndụ I ritula osikapa mmanụ ndụ nke e ji nkụ sie? Kwuo eziokwu - ọkwa ọ fọrọ obere ka ị were ire rachaa efere gị? Osikapa a na-atọ ụtọ mana ọ na-akacha mma iji nkụ sie ya makana ụtọ nkụ ahụ na-eme ka ọ tọwaa ntị. Ihe ndị e ji esi ya gụnyere: mmanụ nri/ndụ, azụ ọkpọ, ịsha, nnu, yabasị, nchanwụ, ose, ụfọdụ na-eji ogiri, ehuru na ehu, nakwa ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tụ mmadụ n'ọnụ, anụ maọbụ azụ. Etu ị ga-esi sie ya: Situ osikapa gị n'ọkụ mana ekwela ya ghee eghe tupu i fọtuo ya n'ọkụ. Wụpụ mmiri dị na ya. Sikọta mmanụ nri, azụ ọkpọ, ịsha, ose na ngwa nri ndị ọzọ ọnụ ka ọ sụkọta (ụfọdụ na-eghe mmanụ eghe tupu ha esiwe) Ihe ndị a sụkọchaa ọnụ, wụnye osikapa ahụ tinyezie ya mmiri ga-ezu ime ka o ghee Tinye ya nchanwụ na nnu ga-atụ ya ma mmiri tawa; kpuchikwaa ya Gbadaa ọkụ ma ọ tawa, ka ọ ghara ịgba ọkụ Osikapa mmiri akịoyibo Ị ma na a na-eji akị oyibo esi osikapa? A na-akwọ akị oyibo ahụ, pịpụta mmiri ya were ya sie osikapa. Ihe ndị e ji esi ya gụnyere: mmiri akị oyibo, nnu, ose, yabasị, ụfọdụ na-etinye ya tomanto, mmiri anụ/azụ nakwa ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tụ mmadụ n'ọnụ, anụ maọbụ azụ. Etu ị ga-esi sie ya: Situ osikapa gị n'ọkụ mana ekwela ya ghee eghe tupu i fọtuo ya n'ọkụ. Wụpụ mmiri dị na ya. Ghekọlata stu, jiri obere mmanụ, wụnye ya mmiri akị oyibo nakwa mmiri anụ Ọ sụkọọ ọnụ, wụnye osikapa ahụ ma kpuchie ya Gbadaa ọkụ ma ọ tawa, ka ọ ghara ịgwọ Osikapa na stu akwụkwọ nri Nke a ga-amasị ma ndị chọrọ ịta ahụ, ndị chọrọ ọbara n'ahụ ha nakwa ndị iri akwụkwọ nri nwereike ị na-ara ahụ. Ọ naghị egbu oge isikọlata ma ncha. Ihe ndị e ji esi ya gụnyere: akwụkwọ nri e biri ebi, mmanụ ọpụpa, nnu, ose, yabasị, ụfọdụ na-etinye ya tomanto nakwa ịsha, nakwa ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tụ mmadụ n'ọnụ, anụ maọbụ azụ. Etu ị ga-esi sie ya: Sie osikapa gị ka o ghee eghe Were obere mmanụ ọpụpa ghekọlata akwụkwọ nri, ị nwereike itinye ya tomanto, tinyezie ya ngwa nri ndị ọzọ Hapụ ya ka ọ sụkọo ọnụ ihe dị ka naanị otu nkeji maọbụ abụọ n'elu ọkụ ị gbadara agbada Osikapa na agwa Ọ bụrụ na ị toro n'ụlọ, nke a ga-edo gị anya ọfụma. Ụtọ osikapa na agwa e sikọtara ọnụ ọkacha nke jọlọf, abụghị ihe a na-akọrọ mmadụ, ọ kaara gị mma na ị jiri aka gị detu ya ọnụ. Ihe ndị e ji esi ya gụnyere: agwa, mmanụ ọpụpa, nnu, ose, yabasị, ụfọdụ na-etinye ya tomanto nakwa ịsha, nakwa ngwa nri ndị ọzọ na-eme ka nri tụ mmadụ n'ọnụ, anụ maọbụ azụ. Etu ị ga-esi sie ya: Sie osikapa na agwa gị ka o ghetu eghe (ka agwa gị ka osikapa gị ghee) Ghekọlata stu gị Wụnye mmiri ga-ezu ime ka osikapa na agwa ahụ ghee Wụkọọ ha ọnụ n'ime ite ahụ ma kpuchie Tinye nnu etu o si tụ gị n'ọnụ ma hapụ ya ka o ghee ma takwaa mmiri Ugbu a ị mụtara, kedụ nke ị ga-aga ịnwa n'usekwu gị? Akụkọ ga-amasị gị: Onye nwe ihe nkiri mgbariọtọ Maryam na Deezell na-agbagha? 'Ọnweghị ụka Alakụba gọọmenti na-arụ n'Enugu steeti' - Arch. Bishop Chukwuma 'Nyochakwaa 'genotype' tupu ị lụọ onye ọbụla ị chọrọ ịlụ' - Eucharia Anunobi Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Nri", "Ọrụ ugbo" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51432790
Onye nwe ihe nkiri mgbariọtọ Maryam na Deezell na-agbagha?
Onye na-eme ihe nkiri na Naịjiria akpọrọ Maryam Booth ekwuola okwu gbasara ihe nkiri mgbarịọtọ ya na-ewu na soshal midia.
2020-02-09T09:09:51Z
Deezell na Maryam Booth: Onye nwe ihe nkiri mgbariọtọ ha na-agbagha?
Booth/Deezell Maryam Booth bụ onye na-eme ihe nkiri na Naịjirịa ama ama ekwuola ihe ọ ma maka ihe nkiri mgbarịọtọ a na-eche na ọ bụ ya na-efegharị n'elu soshal midia. O depụtara n'akara Instagram ya na ọ bụ onye bụbu ọyị ya nwoke akpọrọ Ibrahim Ahmad Rufai sere ya foto mgbarịọtọ ahụ mgbe ha na-eme enyi n'afọ atọ gara aga. Ebe ụmụakwụkwọ abụọ mahadum Babcock siri 'daa iwu' Ihe 5 ndị nwere ọtụ kwesiri ịma Ọ kwuru na Rufai na-ana ya ego ka ọ ghara iwepụta ya bụ foto mana ọ gbagwojuru ya anya ka ya bụ foto si pụtakwazịa n'elu soshal midia. Ọsịsa ya na-abịa ka Rufai onye eji Deezell wee mara gọnahụrụ ya bụ okwu site n'idepụta ogologo okwu n'akara twitter ya. Kamgbe ahụ ndị mmadụ amanyela ọnụ n'elu soshal midia. @fag_glamour si na ihe nke a gbagojuru ya anya. @ArewaWoman kwuru na ọ bụ ọyị rara Maryam Booth nye @EagleAdekoya kwuru na onye ọbụla na-eme ọfụma ga-enweriri nkatọ. Ụmụ ụwa ka na-eche ka ha hụ ihe ọzọ ga-esi na ya bụ okwu pụta. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọkụ ngaji n'eze, lee ụzọ 9 ị ga-esi rie osikapa ka ọ tụ gị n'ọnụ 'Ọnweghị ụka Alakụba gọọmenti na-arụ n'Enugu steeti' - Arch. Bishop Chukwuma Kọntena esila n'elu dagide otu nwaanyị na Legọs Ihe ndị mere ka izu a bụrụ daachịị
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51432481
Ihe pụtara na nzuko ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu
Ndị gọvanọ na-achị Steeti ndị dị n'ọwụwanyanwụ nwere nzukọ n'Enugwu taa.
2020-02-09T12:38:45Z
South-East governors: Ihe pụtara na nzuko ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu
Ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwanyanwụ nke Naịjirịa nwere nzukọ n'Enugwu Steeti taa. Ozi a si n'aka gọvanọ na-achị Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi bụ onye lere ha ọbịa n'obi ọchịchị ya dị n'Enugwu. Usoro mmepe ala Igbo amalitela Ọ bụ eziokwu na Ebonyi esoghi na Biafra? Ndị so n'ọgbakọ ha gụnyere gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi, gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia na osote gọvanọ Anambra bụ Nkem Okeke. Ndị ọzọ bụ ọkanmụta Barth Nnaji, onyeisi ọgbakọ ha bụ ọkanmụta Simon Ortuanya na ndị ọzọ. Dịka ọ dị ugbua amabeghi ihe ha kpatara na nzukọ a mana akụkọ banyere ya ka na-abịa... Nwada Igbo chọtara ihu ọma n'aka gọvanọ Borno Steeti Gọvanọ Borno steeti na Obiageli Mazi mgbe ọ jere njem nleta mberede Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum ajaala Obiageli Mazi mma na ndụ maka uchu na mbọ ọ na agba n'ọrụ nkuzi ya. Gọvanọ ahụ mere njem mberede n'ụlọakwụkwọ ya bụ nwaanyi n'isi ụtụtụ Fraịde were zute naanị ya n'ọrụ n'elekere isii nke ụtụtụ. Henry Onyekuru anarala ihe nrite Nwaafọ Igbo, Nneka Arimah eritela nturuugo Caine nke 2019 Gọvanọ buliri ya n'ọkwa ma nyekwa nwaego mmachiakpa. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka atụmaatụ a n'elu soshal midia @henryshield kwuru na etu a esi gosipụta atụmaatụ a nwereike itinye ndụ nwaanyị a na nsogbu. @TeemahK1 na-eto gọvanọ Borno maka obioma ya. @ogundamisi na-eto onye nkuzi a maka etu o si nọrọ na-agba mbọ na steeti ahụ agbanyeghị ụfọdụ mmekpa ahụ na-eme ebe ahụ. @oil_shaeikh kwuru na ọ bụ etu Naịjirịa kwesiri , nihi na ekwesighị nwe nkewa. Ndị ụka Metọdisti emeela ngagharịiwe Ngagharịiwe ndị ụka Metọdisti Ndị ụka Metọdisti nke Naịjirịa emeela ngagharịiwe megide oke ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na Naịjirịa karịsịa ndị ụka Kraịst. Ọ bụ ụka Metọdisti nke ngalaba Opebi dị n'Ikeja nke Legọs Steeti mere nke a. Adeboye na ụka RCCG na-aga njem ekpere maka nchekwa Cheta n'izuụka gara aga, na onyeisi ụka Redeemed bụ Pastọ Adeboye na ndị ụka ya mere otu ngagharịiwe a n'ihi nchekwa na Naịjirịa. Atụọla ndị agha gburu mmadụ nga Onye nọ na mkpọro Ụlọikpe ndị agha Naịjirịa amaala mmadụ atọ ndị otu ha ikpe afọ iri maka iji arụrụala rụgbụọ onye otu ha. Majors Oseni, Ogbemudia Osawe, Captain Amosu na Second Lieutenant Nuhu Dogary gburu Bejamine Collins n'afọ 2017. Egburu ndị agha Amerika abụọ Ndị agha Amerika N'ofesi, ndị agha mba Amerika ekwuola na egburu ndị agha ha mmadụ abụọ ma meruo isii ahụ na ọwụwa anyanwụ mba Afganistan. Ọnụ na-ekwuru ndị agha Amerika ebe ahụ bụ Sonny Leggett sị na onye mere ihe a yi akwa ndị agha Afganistan kpọpere mgbo ebe ndị agha ndị ọzọ nọ. Shieffield na Bournemouth Sander Berge Onye egwu Sander Berge bụ onye Shielffield United gotere ọhụrụ akwadowela egwu mbụ ya N'egwuregwu, Sheffield United ga-ezute ndị Bornemouth n'elekere abụọ nke ehihie a na asọmpị premier league. Gee akọkọ ndị n'otu nkeji Bishop Chukwuma etinyela ọnụ n'okwu Ụlọụka Archi Bishop ndị Anglikan nke Enugu bụ Emmanuel Chukwuma ekwuola na kepu kepu a juru sosha media kemgbe na gọọmenti Enugu steeti ruru ụlọ ndị Alakụba bụ ọkpụrụ kpụrụ asi. Chukwuma sị ndị na-agbasa ya bụ asiri wepụ aka enwe n'ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ. Fashola sị na iji mmadụ gwọọ ọgwụ ego anaghị arụ ọrụ Minista na-ahụ maka ọrụ na ụlọ, Babatunde Fashola ekwuola na iji mmadụ gwọọ ogwuego adịdghị ire ma rịọ ndị na-eme ihe nkiri ha ejizina ya eme ihe nkiri. Fashola kwuru nke a n'ọgbakọ ekpokobara maka nchekwa obodo ebe ọ nọ sị ndị ọnụ na-eru n'okwu kawa ahụ gwa ndị mmadụ nke bụ eziokwu. Agbagbuola onye gburu ndị mmadụ na Thai Land N'ofesi, ndị ọrụ nchekwa egbuola ya bụ onye agha gburu onyeisi ya nakwa mmadụ iri abụọ na Thai Land. Odobeghị anya ihe mere Jakraphanth Thomma jiri kpaa udi agwa ahụ mana Minista ahuike mba ahụ kelere ndị ọrụnchekwa maka ịkwụsị ya bụ nwoke. Raheem Sterling agaghị eso gbaa bọọlụ ndị West Ham N'egwuregwu, Manchester City ga-ezute West Ham taa na ọgbọegwuregwu ha bụ Etihad. Onyeegwu ha bụ Raheem Sterling agaghị eso gbaa maka ahụ o meruru mgbe ha na Tottenham gbara bọọlụ n'izuụka gara aga. Gee akụkọ ndị n'otu nkeji
[ "Naijiria", "Abia Steeti", "Premier League", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Anambra Steeti", "Ebonyi Steeti", "National security", "Imo steeti", "Enugwu", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-51441430
Boko Haram awakpoola ndị nọ njem ma gbuo mmadụ 30 na Borno
A na-eche na ọtụtụ ndị nọ njem nwụrụ na mwakpo a mere n'ụtụtụ Monde.
2020-02-10T06:56:18Z
Boko Haram awakpoola ndị nọ njem ma gbuo mmadụ 30 na Borno
Mmadụ 30 nwụrụ n'ụtụtụ Mọnde n'obodo Auno dị n'isi obodo steeti Borno bụ Maịduguri nso, dịka ndị hụrụ ihe mere siri kwuo. Aka na-achị steeti ahụ bụ Babagana Zulum gara ebe ihe a mere were kwuo na ndị bi ebe ahụ gwara ya na ọ bụ ndị nọ n'ime ụgbọala ka ọdachị a dakwasịrị. Agbakwara ụfọdụ ụgbọala ọku na-ebe ahụ ma tọrọkwa ọtụtụ mmadụ. Otu onye no nso ebe ihe a mere dere maka ya n'akara Twitter ya. Govanọ Zulum gwara ndị ya bụ ihe metụtara ka ha kara obi. Onye ọzọ na Twitter tinyekwara ihe ọ sị bụ ihe onyonyo mwakpo a . 'Ndị Igbo ga-eji ihe ọbụla ha nwere zọọ isi onwe ha' - Nnia Nwodo Nnia Nwodo Onyendu ndị Ohaneze ndị Igbo bụ Nnia Nwodo adọọla aka na ntị na ndị Igbo agaghịzị anọ na nkiri ana egbu ndị be ha. Nwodo kwuru nke a n'ọgbakọ ime obi ha nwere ụbọchị Sọnde n'Enugwu sị na Ndị Igbo ga-eme ihe niile ha nwere ike ime iji chekwaa onwe ha Naịjirịa. Akụkọ kachasị n'abalị: Ohaneze ndịgbo enyeela Buhari iwu kpụ ọkụ n'ọnụ Hazigharịa ọnọdụ nchekwa n'Ọwụwa anyanwụ - IGP Sineti: Chụọ ndị isi ọrụ nchekwa Na ya bụ ọgbakọ ndi Ime Obi nwere na Nike Lake n'Enugwu, Nwodo gwara ndị ntaakụkọ ka onye ọbụla ghara iji Ndi Igbo tie epele. Ọ sị na ya agaghịzị ekiri ka ana egbu Ndịgbo. Na ya bụ akwụkwọ ha biputere ndị ntaakụkọ ndị Ime Obi sị na "Ohaneze agaghịzị ekiri ka na-egbu Ndịgbo. Anyi ga-eme ihe ọbụla anyi nwere ike iji chekwa ndụ onye Igbo ọbụla n'ala Igbo." Nke a mere ka ha họpụta ndị Ichie na ndị nwere agba ga-enwe ike ka ha na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kpaa nkata mirieme maka ọdọdụ nchekwe Alaigbo. Ohaneze kwuru na "ọ bụ ezie na ọnọdụ nchekwe n'ala Igbo adịghị nfe mgbe ọbụla, mana anyị na-eji akọ na uche na onyinye chi nyere anyị azọ onwe anyị. Onye ejikwala Ndị Igbo tie epele." Ụfọdụ ndị bịara ya bụ nzụkọ gụnyere Archbishop Emmanuel Chukwuma, Peter Obi, Chief Achike Udenwa, Prof. Oriakụ Uche Azikiwe, Chief Mbazulike Amaechi, Hon Tobi Okechukwu, na Dr Walter Ofonagoro. N'aka ọzọ, ọgbakọ ndị gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ enyela ntuziaka ka ndị ụlọomeiwu ha dị icheiche malite ịbado iwu ga-enye ikike ịmepe otu nchekwa nke ndị ọwụwa anyanwụ. Onyeisioche ha bụ Gọvanọ Dave Umahi kwuru na ha edegerela gọọmenti etiti akwụkwọ maka nke ahụ. Umahị sị na ndị ọwụwa anyanwụ amaltelarị otu nchekwa nke ha kemgbe 28 Julaị 2019 ma mee ntọnala ya na ọnwa 31 ọgụst 2019. Aisha Buhari etiela mkpu maka itibọrịbọ n'Ugwu Awusa Nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari etiela mkpu maka itibọrịbọ karịrị n'Ugwu Awụsa. Aisha bụ onye tiri mkpụ a mgbe ọ na-emepe ogige ịzụ ụmụaka narị asaa na ụmụ iri ise na-arịọ gọọmenti ka ha kpọọ ya bụ msogbu mkpa. UK etiela mkpu maka Coronavirus N'ofesi, gọmentị United Kingdom etinyela Coronavirus dịka ọrịa cheere ha ezigbo akamgba nke mere ha ji sị Chaịna bulata mmadụ narị abụọ ụbọchị Sọnde. N'iwu ọhụrụ ha tiri, gọmenti nwere ike ịkpọchị onye ọbụla gafere ụzọ ya bụ ọrịa ma sie ọnwụ na ọ gaghị apụ ruo mgbe ha mechere nchọncha ha. Mmadụ anọ bu ya bụ ọrịa na UK ka ọ dị ugbua. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Inter Milan anwụọ AC Milan anya N'egwuregwu Italia Serie A a gbara ụnyahụ, Inter Milan ji ọkpụ anọ asatara abụọ merie AC Milan. Nke a mere ka Inter Milan sị na nkatụ nke atọ mafere na nke mbụ n'ogogo AC Milan. Kepu kepu egwuregwu bọọlụ Klopp chọrọ ịkpọta ya Anfield Kepu kepu na-erute anyị ntị na otu Bayern Munich na-akwado imefu paund iri asaa na ise n'isi Roberto Firminho nke Liverpool i jị kpota ya Allianz Arena. N'aka nke ọzo ka Jurgen klopp nke Liverpool na-akwado ikpọghachita Phillippe Coutinho onye ndị Barcelona binyere Bayen munich. Onye agha gburu ọchụ gbara ọsọ Onye agha Naịjirịa so na ndị amara Ikpe afọ iri maka ịrụgbu nwanne ya n'ụrụ eriela mbọmbọ ọsọ n'ụlọikpe ebe anọ maa ha ikpe. Akeem Useni sọ na mmadụ anọ ndị ọzọ a mara ikpe ụbọchị Fraịde sị ka ya kele nwaanyị akpị gbara were si ebe ahụ waa. Nzuko ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu A malitela ikpe ndị Boko Haram ikpe Ndị agha anwụchiela Bobrisky Ndị agha Naịjrịa amalitelarị isi imi n'ala ịchọta ebe ya bụ nwaamadị gbagara. Akwụkwọ ndị agha biputere maka ọchịchọ Useni gosiri na ha agbasaala ozi nye ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwe ndị ọzọ maka ọchịchị Useni. Useni so na mmadụ anọ ji ahụhụ tagbuo onye otu ha bụ Bejamine Collins onye si River steeti maka ịhapụ ogige ndị agha na-enwetaghị ikike n'afọ 2017. Mmadụ anọ ahụ gụnyere Useni sị ebe edowere Collins na Mogadishu Barracks kpọrọ ya ga na-akụkụ ọhịa diketere Ihejirika Quarters dị n'ụzọ Abuja-Nyanya Expressway ebe ha nọ rụgbụo ya. Ihe nkiri African Eye ka apụta taa Dịka a na-ekwụ maka ụzọ arụrụala dị iche iche ndị ọrụ nchekwa jị aghụpụta ndị mmadụ okwu n'ọnụ, BBC African Eye ewepụtala ihe nkiri gbasara nke a taa bụ Mọnde. Kee nkwụcha chebiri ya. Ọ ga adị kpọkpọ Ọgbakọ African Union Onyeisiala Muhammadu Buhari etoola ndị otu ECOWAS maka mbọ ha na-agba iji buso ndị omekataraihepụọụjọ agha n'Afrịka. Buhari kwuru nke a n'ọgbakọ nke iri atọ na atọ nke ndị otu African Union nke na-aga n'ihu ugbua n'Addis Ababa, Ethiopia. Oscar 2020 Oscar 2020 N'ofesi, ihe nkiri a kpọrọ Parasite nke ndị Saụt Koria eturula ugo nke Oscar 2020. Ya bụ ihe nkiri bụ nke mbụ e ji asụsụ mba ọzọ mee tutere ya bụ ugo kemgbe a malitere ya bụ emume n'afọ 1929. Gee akụkọ ndị n'otu Nkeji Akụkọ ga-amasị gị Kọntena esila n'elu dagide otu nwaanyị na Legọs 'Nyochakwaa 'genotype' tupu ị lụọ onye ọbụla ị chọrọ ịlụ' - Eucharia Anunobi Ihe ndị mere ka izu a bụrụ daachịị
[ "Naijiria", "National security" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51450717
Ihe nwereike igbu nwoke n'elu nwaanyị
Ndị Igbo na-asị na ihe na-atọ ụtọ na-egbukwa egbu, etu a ka ọ dị ma a bịa na mmekọrịta nwoke na nwaanyị.
2020-02-10T19:46:56Z
Death during sex: Ihe nwereike igbu nwoke n'elu nwaanyị
Nwoke na nwaanyị nọ n'elu akwa A nọkata nọkata a nụ na nwoke nwụrụ n'elu nwaanyị maọbụ na nwaanyị nwụrụ n'okpuru nwoke, mana gịnị na-ebute ya? Ụfọdụ na-anwụ site n'ume ngwụ, ụfọdụ na-anwụ site na nkubi ume, ụfọdụ na-anwụ site n'ụzọ ndị ọzọ dị iche iche. E kwesịrị ikuziri nwatakịrị maka 'mmekọ nwoke na nwaanyị'? Utu rọba ana egbochi gi ịnwete ụtọ mmekọ nwoke na nwaanyị? Ihe mere ndị mmadụ ji eze 'ihe nsori' Mana ndị ọkammụta sayensị emeela nnyocha ịchọpụta ihe ndị nwereike ibute ọnwụ mgbe nwoke na nwaanyị na-enwe mmekọrịta ahụ. Dkt. Issa Dahabreh nke Tufts Medical Center dị n'obodo Boston, na mba Amerịka, mere nchọpụta na ụfọdụ ndị na-anwụ n'ihu ọrụ n'ihi obi nkoropu. Ọ kọwara na ụfọdụ oge, mmekọrịta nwoke na nwaanyị na-adị ka mmegharị ahụ nke na-adị ka ahụ gị ọ na-arụsi ọrụ ike; nke a nwereike ime ka mmadụ nwee obi nkoropu ọkachasị ndị na-anaghị emegharịbu ahụ oge ọbụla. Gịnị nwereike igbu gị n'elu nwaanyị? 1)Ịṅụ ọgwụ tupu ị rịa ya elu: E nwere ọgwụ ndị a na-ere maka ụmụnwoke ịṅụ tupu e dina nwaanyị, otu n'ime ha bụ nke a na-akpọ Viagra. Mana ebe ndị dọkịta na-ekwu na ọ bụ nwoke amụ ya anaghị ekelinwu kwesịrị ịṅụ ọgwụ a, ụfọdụ na-akachi ntị ṅụọ ya makana ha chọrọ ka o mee ka amụ ha kwụdosie ike oge ha na-arị nwaanyị elu. Ọ na-abụzị nsogbu nye ụfọdụ ụmụnwoke ọkachasị ndị nwere ọrịa obi (ụfọdụ anaghị ama na ha nwere ọrịa obi), n'ihi na o nwereike ime ka ume ọsọ mewe ha mgbe ha nọ n'ihu ọrụ nke nwereike ibute ọnwụ. Ụfọdụ ndị ọ na-enye nsogbu bụ ndị na-aṅụ ihe karịrị ole ha kwesịrị ịṅụ tupu ha eruo n'ihu ọrụ. Ndị dọkịta na-ekwu ka a ṅụọ naanị otu mkpụrụ kwa ụbọchị n'ime ihe ruru otu awa tupu ị gaa n'ihu ọrụ, mana ụfọdụ na-aṅụ ihe karịrị otu. 2)Ọrịa obi: Dkt McGinger Ibeneme gwara BBC na n'ihi na mmekọrịta nwoke na nwaanyị dị ka ebe mmadụ na-emegharị ahụ ga-eme ka mmadụ na-eku ume ọsịsọ, na o nwereike itinye onye nwere ọrịa obi na nsogbu. O kwuru na onye okporo obi esighi ike nke bụ 'weak artery' na Bekee, na ọbara nwereike gbaruosie ebe ahụ ike nke ga-eme ka nsogbu nwereike ibute ọnwụ dapụta. O kwukwara na oke ọbara ịgbaju n'isi nke bụ 'cerebral haemorrhage' site n'ihe Bekee kpọrọ 'adrenaline rush' nwereike ibute nsogbu oge nwoke na nwaanyị na-enwe mmekọrịta. Nke bụ na oke ọbara gbajuo, o nwereike ikpachi ebe ikuku ndụ si abata, ọ bụrụ na ikuku ndụ ezughi ọ bụzịkwa ọnwụ na-akụ aka n'ụzọ gị. 3) Mkpọnwụ ahụ: Dkt Ibeneme kwuru na n'ihi etu mmekọrịta nwoke na nwaanyị si atọ, ụfọdụ oge onye nwere ọbara mgbali elu nwereike ịbanye na nsogbu. Ndị ọkammụta kwuru na ọ rakwara ahụ ịhụ ebe mmadụ nwụrụ site na mkpọnwụ ahụ a, mana mmadụ nwereike inweta mkpọnwụ ahụ site na mmekọrịta. Akụkọ ga-amasị gị: Ọkụ ngaji n'eze, lee ụzọ 9 ị ga-esi rie osikapa ka ọ tụ gị n'ọnụ Boko Haram awakpoola ndị nọ njem ma gbuo mmadụ 30 na Borno Ihe T.A Orji na-eme maka 'billions' a na-enyocha n'ọbaego nwa ya Ihe ise anyị ma maka ọrịa ọhụrụ pụtara na Benue steeti Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Mmekọ nwoke na nwanyị", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51459107
Ihe niile i kwesịrị ịma maka otu nche ọhụrụ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ hibere
Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ehibela otu nche ọhụrụ mana ha amalitebeghi ọrụ n'uju.
2020-02-11T12:17:47Z
South East Security: Ihe niile i kwesịrị ịma maka otu nche ọhụrụ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ hibere
Ndị nchekwa 'Forest Rangers' Gọọmentị Enugwu steeti hibere otu nche a kpọrọ 'forest rangers' Dịka ohi, ntọ na igbu mmadụ dị ka ọ na-arị elu na Naịjirịa, ndị gọvanọ mpaghara dị icheiche ehiwela otu nche nke ha. Otu ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kwuru na ha ehiwela otu nchekwa nke ha kamgbe ọnwa Jun 2019. Ọ bụ n'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị 9 nkd Februwarị ka ha kwuru nke a. Kedụ ndị bụ 'Forest Rangers' a Enugu Steeti na-achọ ihiwe? Nzuko ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ amachiela ịchị ehi agagharị Nzukọ ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu Ndị mpaghara ọdịda anyanwụ ehibela otu nke ha a kpọrọ 'Amotekun', ebe ndị mpaghara ugwu nwere nke ha kpọrọ 'shege fa fasa'. Mana ndị otu gọvanọ ọwụwa anyanwụ kwuru na ha enwetabeghị aha maka otu nche nke ha hibere ọhụrụ. Lee ihe anyị ma gbasara otu nche ọhụrụ a: Gọvanọ Willie Obiano nke Anambara steeti yi akwa ndị ọrụ nchekwa Otu jikọrọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ hibere otu nche a n'abalị 28 nke ọnwa Julaị afọ 2019. Ha hibekwara kọmiti ga-ahazi otu ndị nche ahụ n'abalị 31 nke Ọgọst 2019. Kọmiti ahụ ga-agba mbọ ịhụ na ụlọomeiwu niile dị n'ọwụwa anyanwụ ga-emepụta iwu ọhụrụ ga-akwado otu nche ọhụrụ ahụ. Otu nche ọhụrụ a enwebeghị aha; kọmiti ahụ ga-ecehpụta aha a ga-akpọ ya. Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ edegarala gọọmentị etiti akwụkwọ iji kọọrọ ha maka atụmatụ nche ọhụrụ a. Ha ga-akpọkwa gọọmentị etiti ka ha bịa were anya ha hụ ya ma ọ malite nke ọma. Ka ọ dị ugbua ndị nche 'vigilante' na ndị nche ime obodo a kpọrọ 'forest guards' ka na-arụgodi ọrụ nche ugbua. Ụgbọala ndị nche Amotekun Cheta na gọọmentị etiti gbarụrụ ihu oge ndị gọvanọ ọdịda anyanwụ malitere otu 'Amotekun'. Nke a mere ka ndị mpaghara ahụ ọnụ na-eru n'okwu gara n'obi gọọmentị n'Aso Rock ebe ha nọrọ kapịa ya ọnụ. Ọ bụ eziokwu na ndị ọchịchị na mpaghara ugwu ekwenyeghi na ọ dị mma ka mpaghara dị icheiche nwee ndị nche nke ha. Mana ndị nkwado atụmatụ na-ekwu na onye arachaghị ọnụ ya, ụgụrụ arachaa ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe T.A Orji na-eme maka 'billions' a na-enyocha n'ọbaego nwa ya Mba Chaịna eziterela Naijirịa ntụzịaka maka igbochi coronavirus Boko Haram awakpoola ndị nọ njem ma gbuo mmadụ 30 na Borno Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Abia Steeti", "Enugu Steeti", "Anambra Steeti", "Ebonyi Steeti", "National security", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51443129
'Anyị enwebeghị okwu'- Ọnụ na-ekwuru Nwa T.A Orji
Ọnụ na-ekwuru Chinedum Orji bụ Uzoma Okoro ekwuola na ha ka ga-agwa ụwa okwu gbasara nyocha 'Economic and Financial Crimes Commission' na-eme ha.
2020-02-11T14:05:08Z
EFCC vs T.A Orji: 'Anyị ka na-enwe mkparịtaụka maka ihe anyị ga-asa ụwa'- Ọnụ na-ekwuru Nwa T.A Orji
Chinedum Orji bụ nwa Sịnetọ T.A Orji aka chiburu aka Abia Steeti Chinedum Orji bụ omeiwu na-anọchite anya Umuahia Central ka a họpụtara na-enweghi onye mara ya aka n'ihu. Ọnụ na-ekwuchitere nwa onye bụbu gọvanọ Abia steeti ekwuola na nwamgbe nta ha ga-apụta gwa ụwa okwu gbasara nnyocha EFCC na-enyocha T.A Orji na nwa ya. EFCC: Ndị anyị gara ịchọ bụ ụmụ T.A. Orji Ụlọikpe mkpegharị enyela Orji Uzor Kalu mmeri Uzoma Okoro kwuru na ha ga-akpọ ndị ntaakụkọ oku mgbe ha di njikere ikwu okwu. Ihe wuru ụbọchị itoolu nke Februwarị niile bụ na ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commision (EFCC) na-enyocha nde kwuru nde achọpụtara n'ọbaego Chinedum Orji, nwa aka chiburu Abia steeti bụ Theodore Ahamefula Orji. Mana ọnụ na-ekwuru T . A Orji ekwuola na ha ga-ekwu okwu gbasara ya bụ ebubo n'oge na-adịghị anya. Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade kwuru na ya bụ ebubo bụ nke otu a kpọrọ 'Save Nigeria Group' depụtara n'akwụkwọ mkpesa ha wepụtara kamgbe ọnwa Maachị nke afọ 2017. Akwụkwọ ebubo ahụ kwuru na T.A Orji, oge ọ bụ gọvanọ Abịa steeti, nwetara ma bubaa n'akpa ya ego e kenyere ya iji rụpụta ihe na steeti ahụ. Lee ụfọdụ ego e depụtara n'akwụkwọ mkpesa ahụ N383 billion - ego si n'ọba ego gọọmenti etiti N55 Billion - ego ọma eretelu ka erechara ego mmanụ agbịdị N2.3 billion - ego Sure-P N1.8 billion - ego ewepụtara maka ilebanya mmekpa ahụ gburu N10.5 Billion - ego ebitere n'aka ụlọakụ ukwu Naịjirịa N4 billion - ego diamond Bank N12 billion - ego Paris Club refund N2 Billion - ego ebitere maka ndị ọrụ ugbo. N55 billion - ego ASOPADEC 'Save Nigeria Group' depụtara na ha chọpụtara ọba ego ruru otu narị bụ nke Chinedum Orji nwa Theodore Orji. Mana Orilade kwuru na ụlọọrụ ha ka na-enyocha ya bụ ebubo. Anyi ga na-ege ntị ka anyị mara ihe ha nyochapụtara. Cheta na n'afọ 2018, EFCC kwuru na ha na-enyocha ụmụ T.A Orji maka ego ruru nde iri abụọ na asaa (N27bn). Akụkọ ndị ga-amasị gị Otu n'ime ndị agha a mara ikpe ọchụ eriela mbọmbọ ọsọ Ọkụ ngaji n'eze, lee ụzọ 9 ị ga-esi rie osikapa ka ọ tụ gị n'ọnụ Nzuko ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu Onye nwe ihe nkiri mgbariọtọ Maryam na Deezell na-agbagha?
[ "Naijiria", "Abia Steeti", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-51451540
'Aka Tinubu dị na mkpọrọ a tụrụ m' - Orji Uzor Kalu
Orji Uzor Kalu ekwuola ebe ọ na-eche na nsogbu ya si.
2020-02-11T18:31:15Z
Orji Uzor Kalu: 'Aka Tinubu dị na mkpọrọ a tụrụ m'
Sịnetọ Orji Uzor Kalu Omeiwu, Orji Uzor Kalu a tụrụ mkpọrọ afọ iri na abụọ etiela mkpu n'ọzara maka mkpọro a tụrụ ya. Ọ sị na ọ bụ Ahmed Bola Tinubu, onyendu ha n'All Progressives Congress (APC) bụ onye dowere ya na ya bụ ọnọdụ. Biko tọhapụnụ m ka m gaa ụlọọgwụ - Orji Uzor Kalu Orji Kalu: Enweghi m ọnụ okwu maka akụkọ mmachi njem Ụlọikpe mkpegharị enyela Orji Uzor Kalu mmeri Kalu sị na ọ bụ makana Tinubu na-atụ egwu na ya ga-apụta ịzọsa ya ọkwa onyeisiala n'afọ 2023. Ọ sị na ndị ajọ mmadụ na pati ha bụ APC jere mebie aha ya n'agbanyeghị ahụhụ niile na aja ọ chụụrụ ha. Kalu bụ onye gwara ụlọntakụkọ AlJazeera Naịjirịa nke a n'ụlọmkpọrọ ebe ọ nọ nke dị na Kuje, n'Abuja, kpọrọ Tinubu aha hoo haa dịka onye bụ nsogbu ya. Ọ sị na Tinubu ma na ya bụ "anya ndị ọwụwa anyanwụ" nke bụ na ọ na-atụ ya egwu maka imeri ya na ya bụ ntuliaka onyeisiala nke afọ 2023. PDP amapụtala ezi n'iwe Dịka otu PDP n'Imo steeti kpọrọ ekwo nkụ na ha ga na-eme ngagharịiwe ruo mgbe enyehachịrị ha ọchịchị, ndị otu ha n'Abuja eburula ngagharịiwe gaa ngalaba European Union na African Union ebe a nabatara ha. Ya bụ ngagharịiwe malitere n'elekere iri nke ụtụtụ Tuesday. Omar al-Bashir nwereike ịga mkpọrọ ọzọ Ndịisi ọchịchị mba Sudan akpọfeela Omar al-Bashir bụbu onyeisiala ha n'aka ụlọikpe mbaụwa bụ International Criminal Court. Ebe ahụ ka a ga-ekpe ya ikpe ọchụ, mkpagbu nakwa imebi iwu agha n'ọgbaghara dakwasịrị mba ahụ n'afọ 2003. Ọkụ ọgbụgba n'akụkọ Ọdọugboelu Sam Mbakwe Ndị ọrụ Federal Airport Authority nke Nigeria ekwuola maka ọkụ gbara n'ọhịa n'akụkụ ọdọugbọele Sam Mbakwe dị n'Owerri, Imo steeti. Dịka ha kwuru na ya bụ ọkụ emetutaghị ọrụ ha, ha rịọrọ ndị bịketere ya bụ ọdọugboelu ka ha kpachara anya maka itinye ọkụ n'ọhịa ọkachasị n'ụgụrụ a. Ọkaibe asọmpi ụmụnwaanyị Echi bụ Wenezde ka a ga-akpọpụta aha ndị ga-azọ ọkwa nturuugo Ụmụnwaanyị ọkaibe n'egwu bọọlụ nke ndị BBC na-ahazi. A ga-akpọpụta aha otu onye n'ime mmadụ ise ga-azọ ya bụ ọkwa n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachị 2020. Ndị Boko Haram atọhapụrụ Ndịagha Naịjirịa tọhapụkwara ndị Boko Haram chegharịrị echegharị n'ọnwa Nọvemba 2019 Gọọmentị Borno steeti ekwuola na ndị agha Naijirịa atọhapụla ndị Boko Haram chegharịri echegharị ruru otu puku na narị anọ. Kọmishona mgbasa ozi na Borno steeti bụ Babakura Jato sị kama na ọ bụghị ha niile bụ ndị Boko Haram na ụfodụ bụ ndị eboro ebubo i so n'otu ahụ. Jato kwuru na ọ bụ kamgbe afo 2019 ka ha bidoro ịnwọharị ndịa. O kwuru na ụfodụ ndị a bụ ndị ụfọdụ ndị ezinaụlọ ha so n'otu Boko Haram ebe ụfọdụ n'ime ha bụ ụmụ ndị Boko Haram. Jato kwụru na ụfodu n'ime ha, na ndị obodo ha na-achụpụ ha nke mere ka ha chọrọ ha ebe obibi ọzọ. O kwukwara sị na-enwebeghị mgbe onye ha tọhapụrụ laghachiri soro Boko Haram. Ụlọọrụ na-anọchite anya mba Chaịna na Naịjirịa ezitela akwụkwo ebe edeturu atụmatụ na ntụzi aka bụ nke a ga-eji buso ọrịa coronavirus agha. Dịka onyeisi ndị ọrụ gbatagbata Legọs steeti bụ Olufemi Oke-Osayintolu si kwuo, atụmatụ a gụnyere ihe dị icheiche e nwereike ime iji chọpụta ya bụ ọrịa n'oge. 'Onweghị onye bu ọrịa coronavirus na Legọs' Mba China sị ka anyị ghara ikwu maka Coronavirus - Onye Naịjirịa nọ na China Ntuziaka ndị ahụ gụnyere: Nnyocha ahụ bụ nke bekee kpọrọ lab test. Igbado anya etu ọrịa si agbasa bụ nke a kpọrọ 'Epidemic Update' na bekee. Ịkpachapụ anya maka etu ọrịa si efe (Risk Assessment) Ụzọ nchọpụta na ọgwụgwọ ọrịa ahụ (Diagnosis and treatment protocol). Ịkpachapụ anya maka ndị metụrụ onye bu ọrịa a ahụ (Management of Close Contacts). Ike nkwụcha nakwa ime nnyocha miri emi gbasara ọrịa a (Surveillance and Epidemiological Investigation). Mba Chaịna gosiri na mberede nyịri dika mana ọ bụ mberede ka eji ama dike kamgbe ọrịa coronavirus malitere ịkpa ike na mba ahụ Orịa a malitere na mpaghara Wuhan egbuola ihe karịri otu puku mmadụ ebe ihe karịri mmadụ puku iri anọ bu ya ugbua. Otu ahụike mbaụwa bụ W.H.O ekwupụtala ọrịa coronavirus dịka nke gbatagbata. Coronavirus vs Lassa: Ihe ndị ajọ ọrịa abụọ a ji yie onwe ha Etu e si eme ka garri ghara ibunye mmadụ ọrịa ịba Lassa Anwụchiela onyeagha gburu ọchụ gbaa ọsọ A nwụchiela onye agha Naijira riri mbọmbọ ọso dịka atụrụ ya nga afọ iri maka ọnwụ Lance Corporal Benjamin Collins. Anwụchịrị onye agha a bụ Major Akeem Oseni n'ọdọ ụgbọelu Cotonu dịka ọ chọrọ ịsi ebe ahụ gbaga mba Amerịka. N'Ofesi N'akụkọ yiri ibe ya si ofesi na-ekwu na ndị mba Chaịna ji iwe chụpụ n'ọchịchi ndị isi ngalaba dị iche iche na-ahụ maka ịchụpụ ya bụ ọrịa corona. Dịka ọ dị ụgbụa, mmadụ puku anọ na abụọ na narị asaa na abụọ bu ya bụ ọrịa ebe ihe karịrị otu puku mmadụ anwụọla site n'ọrịa corona na Chaịna. Joseph Shabalala Joseph Shabalala jị egwu ya were buso atụmatụ 'Apartheid' agha na Saụt Afrịka Onye oti egwu ama ama bụ Jospeh Shabalala bụ onyeisi otu egwu Ladysmith Black Mambazo anwụọla. Ọ gbara afọ iri asaa na asatọ mgbe ọ nwụrụ. Ighalo ebughị coronavirus Nnyocha Ighalo gosiri na obughị ọrịa coronavirus A sị kwa na nkwụcha abụrụ ụjọ dịka nyocha na mkpọpụ emere Odion Ighalo maka Corona Virus gosiri na ọnweghị ya bụ ọrịa. Ighalo onye si otu Shenshua nke Chaịna were gaa ManUtd ga-eso ha gbaa asọmpị Europa League mgbe ha ga-ezute otu Burges n'ụbọchi iri abụọ nke ọnwa Febuarị na Belgium.
[ "Naijiria", "China", "Manchester United", "Bọọlụ", "Oyi Lassa" ]