source
stringlengths
0
47
title
stringlengths
0
100
description
stringlengths
0
502
date
stringlengths
0
20
headline
stringlengths
0
113
content
stringlengths
0
9.43k
tags
sequence
https://www.bbc.com/igbo/42884090
E gosiri Afrịka n'emume mbido 'Black Panther'
Akpụ ndị mere ihe nkiri 'Black Panther' n'ọnụ maka otu ha si gosi Afrịka n'emume mbido ha.
2018-01-31T20:16:56Z
Ndị ome ihe nkiri 'Black Panther' gosiri Afrịka n'emume mbido ha
Ndị so mee ihe nkiri "Black Panther" goziri omenala Afrịka mgbe ha gara mmeme mbido ya bụ ihe nkiri nke ụlọọrụ Marvel mepụtara. Ha niile kere ekike mba Afrịka di icheiche maka na ha kwuru sị na ọ dị mkpa igosi Afrịka nke ọma. Chadwick Boseman bụ onye jere ozi dịka T'Challa, Eze mba Wakanda, bụ onye e ji maka ya mee ihe nkiri "Black Panther", duuru ndị ọzọ nọ n'ihe nkiri a gaa ebe emere mmeme a na Los Angeles. Ndị dịka Lupita Nyong'o, David Oyelowo, Daniel Kaluuya, Michael B Jordan, Danai Gurira na Angela Bassett kere ekike ndị Afrịka. N'akwụkwọ eji gwa ndị mmadụ maka mmeme a, e dere sị ha jikere ka "ndị eze Afrịka". David Oyelowo bụ nwa afọ Naịjirịa na Nwunye bụ Jessica so bịa emume a Janeshia Adams-Ginyard nọchitere anya Danai Gurari dịka Okoye Dora Milaje na ihe nkiri a Lupita Nyong'o bụ onye Kenya nweterela ihe nrite ndị na-eme ihe nkiri a na-akpọ Oscar Chadwick Boseman bụ onye mere ka T'Challa n'ihe nkiri a Danai Gurira bụ nwa afọ Zimbabwe mere ka Okoye Dora Milaje n'ime ihe nkiri a Ọ ga-adị mma ka ndị ome ihe nkiri ndị ọzọ na Hollywood bido ije omume ha a?
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Ihe nkiri" ]
https://www.bbc.com/igbo/42908212
Uweojii Spain nwụchiri ndị mgbere akwụna
Ụmụnwaanyị Naijirịa eji agba mgbere akwụna na Spain sị na-eji ọtụmọkpọ yi ha egwu na ekwenti.
2018-02-01T17:33:16Z
Mgbere Akwụna: Anwụchiela mmadụ iri na otu na Spain
Ndị akwụna nọ na Benin Izupu ụmụnwaanyị n'ala Naijirịa na-eweta nwute nye ndị gọọmentị Naijirịa Ndị ụweojii nọ na Spain anwụchiela mmadụ iri na otu ndị asi na-atụ mgbere akwụna. Akụkọ kwukwara na ha ji ụfọdụ ụmụ nwaanyị Naijirịa ezupuru n'obodo akpa ego. Anwụchiri ha na obodo akpọrọ Zaragoza ebe ndị uwe ojii zọpụtara umu nwaanyi iri na isii emere ohu mmetọ ahụ. E ji ọtụmọkpọ yi ha egwu n'ekwenti. A manyere ha iwu ikwụ ụgwọ akpakọtara ejị si na Naijirịa zupu ha. Aghọriri ụmụnwaanyi ndịa n'ikwete na ha ga-ebi ndụ kacha nma na yuropụ E kwuru na ndị otu a nwere njikọ na Italy,Germany nakwa Denmark.
[ "Naijiria", "Igba akwụna" ]
https://www.bbc.com/igbo/42914711
Mba US, EU akatọla idu iyi ọrụ Odinga dụrụ onwe ya
Mba US na otu jikọrọ mba ndị ọcha akpọrọ EU n' aha ịchafụ akatọla iyi ọrụ Raila Odinga nke Kenya dụrụ onwe ya
2018-02-02T06:37:04Z
Mba US, EU akatọla idu iyi ọrụ Odinga dụrụ onwe ya
Onyeisi ala US bụ Donald Trump kwuola na ya nwere 'nnukwu mkwayere ugu nye ndị mba Afrịka N' akwụkwọ ozi, ngalaba 'US Department' tinyere na websait ha, ha kwuru sị: " Yunaited Steeti na-enwe obi mwute n' iyi ọrụ nke onye ndu ndị na- ama gọọmenti Kenya aka n'ihu bụ Raila Odinga duru onwe ya ka ọnwa Jenuwari gbara ịrị atọ. "Anyi na-ajụ agwa ọbụla nke megidere Iwu ala Kenya. "A họpụtara Uhuru Kenyatta dịka onyeisi ala Kenya ka ọnwa Ọctoba afọ 2017 dị iri abụọ na ntuliaka nke ụlọikpe kachasị elu na Kenya kwadoro. "Onye ọbụla nwere mkpesa ọbụla kwesiri isoro usoro iwu ala debere." US katọkwara otu gọọmentị Kenya siri mechie ụlọ ntaakụkọ na Kenya si, na ohere onye kwue ka ọ dị ya dị mkpa na ọchịchị onyekwueuche ya, ma rịọ ka ndị ndu na ndị a na-achị na Kenya bido mkparịta ụka maka ịkpa udo na ịdịnaotu. N' otu aka ahụ, otu EU kwuru na iyi ọrụ Raila Odinga duru onwe ya megidere iwu ma katọkwa mmechi gọọment Uhuru Kenyatta mechiri ụlọ ntaakụkọ atọ. Cheta na Gọọmenti etiti mechiburu ụlọọrụ ngosi TV atọ maka na ha gbasara ozi gosịrị Raila Odinga ebe ọ na-edu onwe ya iyi ọrụ ma kpọkwa onwe ya onyeisiala mba Kenya, ebe ulọikpe Kenya akwụsịrị mmechi ahụ ụbọchị Wenesde.
[]
https://www.bbc.com/igbo/42915119
Kansa akpamamịrị ụmụnwoke egbuola ọtụtụ
Nchọpụta ekwuola na ọtụtụ ụmụnwoke na-anwụ site n'ọrịa kansa akpamamịrị.
2018-02-02T12:19:05Z
Ọrịa Kansa akpamamịrị egbuola karịa kansa ara
Onye na-arịa kansa kansa akpamamịr na-aka egosi oge ụmụnwọke ruru afọ iri anọ Ọnụọgụgụ ụmụnwoke na-anwụ site n'ọrịa kansa akpamamịrị akarịala ọnụogụgụ ụmụnwaanyị na-anwụ site n'ọrịa kansa ara dịka nchọpụta siri kwuo na mba UK. Ụmụnwoke na-aka nka pụtakwara na ọtụtụ ka na-enweta mana anwụ site n'ọrịa ahụ. Ndị nyocha gbasara ọrịa kansa nọ na mba UK kwuru na nchọpụta na ọgwugwọ a na-eme maka kansa ara na-amịta mkpụrụ ebe itinye ego gbasara kansa akpamamịrị umụnwoke ga-enyekwa aka. Nchọpụta ọnụọgụgụ pụtara site n'afọ 2015 gosiri na mmadụ 11,819 nwụrụ site na ọrịa kansa akpamamịrị ebe mmadụ 11,442 nwụrụ site na ọrịa kansa ara. Kansa akpamamịrị kachasị n'ụmụnwoke nọ na UK Ndị ọrụahụike ekwuola na nchọpụta n'oge kachasị mkpa iji gwọ akpụ kansa. BBC Igbo gbara Dọkịnta akpọrọ Remi Ajekigbe ajụjụ ọnụ,o kwuru na ọrịa kansa ara ka egbu karịa ọrịa kansa akapamamịrị na Naijirịa. O kwukwara na ebe nsogbu na dịkari bụ na ụmụnwoke anaghị bia nyocha ahụ n'oge.Ha na bia mgbe ihe ọ ka njọ. "A na-agagharị na-akuziri ndị mmadụ n'ulọ akwukwọ,chọọchị,ulọakụ na ebe ndị ọzọ maka ọria Kansa nakwa ka esi egbochi ya". Emume ndị a ka a ga-eji nabata ụbọchị nrụbama ibuso agha ọrịa kansa bụ Februwarị anọ.
[ "United Kingdom", "Awaa etoo" ]
https://www.bbc.com/igbo/42922474
'Edemede Obasanjo bụ egwuregwu ndọrọndọrọ'
Bola Tinubu akpọọla edemede n'ewu ewu nke Obasanjo degara Buhari 'egwuregwu ndọrọndọrọ'.
2018-02-03T04:42:52Z
Tinubu: Edemede Obasanjo bụ egwuregwu ndọrọndọrọ
Tinubu ebe ọ nọ na ọgbakọ ndị otu ya bụ APC na ntuliaka nke afọ 2015 'Edemede ahụ bụ nke aghụghọ' Onyeisi otu nọ n'ọkwa ọchịchị nke a na-akpọ, 'APC' bụ Bola Ahmed Tinubu ekwupụtala okwu maka ihe edemede Obasanjo degara Buhari. Ọ sị na Obasanjo na-egwu 'egwuregwu ndọrọndọrọ' n'edemede ahụ. Ọ sị na ebe ha abụọ bụ ndịchịrị n'okpuru ndị agha, Obasanjo kwesiri ịkpọ ya n'azụ dọọ ya aka na ntị kama ị gwa ya n'ihu ọha. O ruola izuụka abụọ Obasanjo degara Buhari edemede ahụ na-asị ya ritue n'ọkwa,ghara ịzọ ọchịchị na afọ 2019. Ọ sị na ọbụrụ n'obi dị Obsanjọ ocha, o kwesiri ịkpọ onyeisiala Buhari n'akụkụ gbaa ya izu. O kwuru nke a ebe ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ na Owere (Owerri) ka ọ na-akwado ịga mmemme nkwanye ugwu Alex Ekwụeme.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/42931109
Falana: Atala Buhari ụta maka omume ndị na-achị ehi
Falana ekwuola ka a ghara ita Muhammadu Buhari maka mkpamkpa ndị Fulani na-achị ehi na akpa na Naijiria.
2018-02-03T17:08:43Z
Echiche ndị mmadụ n'eche maka Benue na-egosi ndi kwe ekwe
Femi Falana Femi Falana Onye na-ahụ maka mgbasa ozi onyeisi ala Naijiria bụ Garba Shehu ekwuola na ọ bụ ihe ọjọọ ịkpọ Muhammadu Buhari onye 'ogbuọchụ' maka ọtụtụ mmadụ e gburu na Benue steeti. Shehu kwuru na ndị Naijiria kwesiri ikwanyere onyeisi ala ugwu maka na Buhari bụ onye na-eche ndu ha niile. Mana nwere ndị kwe ma ndị ekweghị na mkparịtaụka BBC na-aka ndị okaiwu dị icheche nwere gbasara okwu ahụ. Femi Falana bụ onye okaiwu gwara BBC Igbo n'elu ekwentị na Buhari bụ onye megburu onwe ya. "Aka o ji achị Naijiria esighị ike chacha. Ihe a butere n'oge o kwesịrị ibilite ịhụ maka nkwụsị ogbugbu mmadụ na Benue, onweghị ihe o mere." "Ọ dị zị ka Buhari amaghị ihe na-eme n'obodo anyị. Ọ maghị na ihe emebiala. Ke kọ sị bụ na ndị a na-egbu mmadụ na Benue, mana onweghị onye ọbula ndị a jidere?" Mgbe BBC jụrụ Falana ma o chere na dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na onyeisi ala asọchitere ndị na-achị ehi nke butere nsogbu ahụ jiri aga n'ihu. Falana kwuru na "Ebubo nke a enweghị isi! Chete n'oge ọchịchị onyeisi ala oge gara aga bụ Goodluck Jonathan, n' etiti afọ 2012 na 2016, e gburu mmadụ karịrị puku abụọ. N'oge Obasanjọ, e gburu mmadụ karịrị puku ịrị abụọ n'ime ọgụ dị ichiche." Falana kwukwara na "Ihe a na-eme n'ala Naijirịa bụ nsogbu obodo dara ada. Ọ bụghị maka ọchịchị Buhari." Mana onye okaiwu bụ Lanre Lasisi ekwetaghị n'okwu Falana kwuru. N'okwu ọnụ ya, "Ke ka o si bụrụ na oge ọbụla ndị na-achị ehi gburu mmadu, onweghi onye a na-ejidere? Mana ugbua mgbe ha gburu ndị Fulani na Gboko, ndị uweojii e jidela ndị e chere na ha mere ihe ọjọọ nke a?" Maka nkatọ a na-akatọ Buhari, Lasisi gwara BBC na ndị Naijiria enwerela Buhari ndidi ebe ọ dị ukwu, na nsogbu dị ekwezịghị ha edi. N'okwu ya, onye ọkaiwu ọzọ bụ Chukwuemeka Eze rịọrọ ndị Naijiria ka ha nwere Buhari ndidi. Eze kwuru na "Ọ dịzị n'aka ndị uwe oji na ndị agha ị kwụsị ihe ọjọọ gbasara ogbugbu mmadụ na eleghị anya ma ọbụ onye Fulani ma ọ bụ onye agbụrụ ndị ọzọ."
[]
https://www.bbc.com/igbo/42941625
Nwunye dibia Boko Haram achịliela aka elu
Rabi Abu-Yasir gwara ndị agha Naịjirịa na di ya bụ dibia onyeisi ndị otu Boko Haram bụ Abubakara Shekau.
2018-02-05T06:10:39Z
Nwunye dibia Boko Haram achịliele aka elu nye ndị agha
Ndị agaha Boko Haram Lafia Dole bụ aha agha ebidoro ibuso Boko Haram kamgbe afọ 2015. Onye bụ nwunye dibia na-ahụ maka ahụike onyeisi otu Boko Haram bụ Rabi Abu-Yasir chiliri ndị agha Naịjirịa aka elu ụbọchị Satodee abalị atọ nke ọnwa Febuwarị dịka ha naebu agha a na-akpọ Lafia Dole. Onye nchịkwa agha Lafia Dole bụ Major General Rogers Nicholas kwupụtara nke a oge o nyefere ụmụnwaanyị na ụmụaka dị mmadụ iri asatọ na abụọ ha gbapụtara n'aka ndị Boko Haram ma nyefee ha n'aka ndị ọrụ nchekwa na Borno steti. Rabi gwara ndị ntaakụkọ na di ya bụ dibia na-elebanye anya n'ahụike onyeisi Boko Haram bụ Abubakar Shekau. O kwuru na a gbapụtara ya ụbọchị Fraide dịka ndị agha Naịjirịa chụpụrụ ndị Boko Haram nọ nime ọhịa Sambisa. Dịka ọ na-ekwupụta ka ya na ihe si gaa, Rabi kwuru na ọ masịrị ya etu esi na eledo ya anya maka ọkwa ọ nọ dịka nwunye dibia Shekau. N'okwu ya, "Dị m, abu-Yasirbụ dibia Shekau, ọ na-eledokwa ndị ọzọ ahụ na-adịghị ma na-emekwa iwe ahụ." Etu esi eme m Rabi dịka nwunye dibia Shekau "Ụdị nri m na-eri dị iche n'ihe a na-enye ụmụnwaanyị na ụmụaka ndị ọzọ nọ n'ogige ahụ." Anyị tara ahụhụ n'aka ha, ha dọkwara anyị aka na ntị na ndị agha Naịjirịa ga-egbu onye ọbụla nyefere onwe ya n'aka ha." Ana chosi Shekau ike na Naịjirịa ugbua. "Ha gwara anyị oge ọbụla ka anyị nọnyere ha ma rube isi nye ndị otu ha, mana ndị agha Naịjirịa na-eledo anyị anya na-abụghị ihe ndị Boko Haram gwara nyị." Rabi toro ndị agha Naịjirịa maka mgbapụta agbapụtara ha ebe ọ kpọkuru ndị a tọrọatọ bụ ndịka nọ nime ọhịa ka ha pụta bịa nyefee onwe ha n'aka ndị agha. Nichola bụ onye nchịkọta agha Lafia Dole kọwara na Rabi sọ na mmadụ iri asatọ na anọ ndị agha gbapụtara. O kwuru na mmadụ asatọ nime mmadụ iri asatọ na anọ ahụ agbapụtara na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ndị agha elu Naịjirịa. Onye nchịkota ahụ kwuru na ndị ahụ a tọrọ na-agabiga ntaramahụhụ di egwu n'aka ndị Boko Haram. Nicholas mere ka a mata na a gbapụtara ndị ahụ site n'aka ndị Boko Haram,chụpụb ha ma nọchie isioche Shekau dị n'ọhịa Sambisa.
[ "Boko Haram", "Ntọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/42956347
Ndị ọrụ Imo ga-alaghachị ịrụ ọrụ abali ise
Rochas Okorocha sị na ọtanisi ebeela, yabụ na ndị ọrụ ga-ebido ibịazu ọrụ n'izu.
2018-02-06T06:07:58Z
Ndị ọrụ Imo ga-alaghachị ịrụ ọrụ abali ise n'izuụka
Rochas Okorocha wepụtara ụlọọrụ na ahụ maka aṅụri nke nwanne ya nwaanyị bụ onye ndu. Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha eweliela iwu ahụ o tinyere maka ndị ọrụ bekee ịbia ọrụ abalị atọ n'izuụka. Okorocha kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ zukọrọ ka ọ na-akwado ime mmemme o ji echeta na ụmụ akwụkwọ n'Imo steeti anọọla afọ asaa ma akwụghị ụgwọ akwụkwọ. Rochas machiri ịkwụ ụgwọ akwụkwọ n'Imo steetị mgbe ọ banyere n'ọchịchị. Ọsị na ndị ọrụ ga-amalite ịga ọrụ ụbọchị ise n'ime otu izu site n'ụbọchị mbụ n'ọnwa Machị maka na ọtanisi nke jibu obodo Naịjirịa ebeela.
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Imo steeti", "Ọrụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/42985391
Ụlọomeiwu nta: Chụọ Ibrahim Idris n'ọrụ
Ụlọomeiwu nke nta akpọla onyeisi ala bụ Muhammadu Buhari oku ka ọ chụọ onyeisi ndị uweoji bụ Ibrahim Idris n'ọrụ n'egbughị oge.
2018-02-08T08:27:12Z
Ụlọomeiwu nta: Chụọ Ibrahim Idris n'ọrụ
Ibrahim Idris Ọtụtụ mmadu na-ebo Ibrahim Idris na ndi uwe ojii na ha enweghị ike ị kwusị ọgbaghara na Naijiria Ha sị na Idris enweghị ike ibelata ogbugbu ndị mmadụ na mpụ ndị ọzọ na-ari elu na Naịjirịa ugbua. Ha kwukwara ka onyeisi ala tinye onye uwe ojii ọzọ ga-arụ ọrụ dịka o kwesịrị. Mkpebi a ndị omeiwu mere sotere oku Nuhu Damburam bụ onye otu APC na-anọchite Kano, kpọrọ maka mkpa ọ dị ilebanya na mkpamkpa ndị agboro ndọrọndọrọ na-akpazi na Kano steeti. O boro ebubo na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa anaghị eme ihe ọbụla doro anya maka ọgbaghara jupụtara na'Naijiria ya. Cheta na izu ole na ole gara aga, Sineeti kpọrọ Ibrahim Idris oku ka ọ bia kọwara ha ihe mere ọ nwụchibeghị ndị na-achị ahụ wakporo Steeti Benue ma gbuo mmadụ iri asaa na atọ.
[]
https://www.bbc.com/igbo/43014409
Ihe onye akaebe kwuru maka ọchụ Ozubulu
Onye akaebe n'ikpe ọnwụ mere n'ụlọụka Ozubulu n'afọ 2017 ekwuola na-akpọrọ ya ka o soro ga ọrụ ahụ.'
2018-02-10T07:06:28Z
Onye akaebe ekwuola na a kpọrọ ya n'ọrụ ọchụ Ozubulu
Ụlọụka St Philip Catholic Church Ozobulu Ndị ji egbe gara ụka na St Philip Catholic Church, Ozobulu gbagbu mmadụ iri na atọ biara ụka n' ọnwa Ọgọstụ afọ 2017 Chukwujekwu Eze kwuru n'ụlọikpe ukwu dị na Nnewi, Anambara Steeti na a kpọrọ ya n'ọrụ imemila otu nwoke bụ Aloysius Ikegwuonwu nke ama ama dịka, 'Bishọp' mana ya ekweghị n'ihi na ya achọghị inweta ego site n'ịkwafu ọbara. Ndị ji egbe gbagburu mmadụ iri na atọ ndị biara ụka na, St Philip Catholic Church, Ozobulu n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2017. "Anyị chọrọ udo na ikpe zuru oke" Chukwujekwu Eze kwuru sị: "O nwere otu nwa nwoke aha ya bụ Okpanda onye gwara m na ha chọrọ ịga be 'Bishop' n'Ozubulu ga rụọ ọrụ. "A jụrụ m ya ụdị ọrọ ọ bụ, ya agwa m na Bishop ji ndị mmadụ ụgwọ na Saụt-Afrịka, na ha chọrọ ịga be ya gbagbuo ihe niile dị ndụ. "A jụrụ m ya onye zigara ha, ya asị na ọ bụ Obrocho. Mgbe m kwulitere ya, Okpanda, kwuru na ọ ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na m soro gaa ọrụ n'ụlọ Bishọp. Agwara m ya na achọghị m ịkwọ aka ọbara." Eze gara n'ihu kwuo na ọ bụ mgbe ọ gara ịza oku Okpanda kpọrọ ya n'ụlọ ya ụbọchị so ụbọchị ahụ ka ọ hụrụ Dobby (Onyemaechi Mbanefo), otu na ndị eboro ebubo na ha kpara mkpamkpa ahụ, ha abụọ ndị gbara mbọ rịọ ya ka o soro gaa ije ahụ mana o kweghị. Ndị e boro ebubo na ọ bụ ha kpara nkata ghọrọ ngịga n'okwu mkpamkpa ahụ mere bụ: Onyebuchi Mbanefo, 46, Chukwudi Ugwu, 30 na Great Chinedu Akpunonu, 44. E jidebeghị ndị ọzọ e kwuru na ha soro mee mpụ a. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Aruziwela ahịa Timbershade gbara ọkụ Uru ọmụgwọ bara n'omenala Igbo Egbuola ndịagha Naịjirịa abụọ na Plateau
[]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43021800
Jose Mourinho: Ekwesịrị inye m ihe nrite
Jose Mourinho bụ onye nchịkọta Manchester United chọrọ ka enye ya ihe nrite maka mgbanwe akparamagwa ya.
2018-02-11T09:28:06Z
Jose Mourinho ekwuola na o kwesịrị inweta ihe nrite
Jose Mourinho Achụpụla Jose Mourinho bụ onye nchịkọta Manchester United n'ọgbọ egwuregwu ihe ruru ugboro asaa kemgbe o ji bịa ọrụ na England Onye nchịkọta otu Manchester United bụ Jose Mourinho ekwuola na o kwesịrị inweta ihe nrite maka na akparamagwa ya agbanweela. Okwuru sị na o sitere n'ịbụ onye a na-amakarị ikpe ma chụpụ n'akụkụ ọgbọ egwuregwu, bụrụzịa onye a na-anaghị achụpụ (ikpeazụ achụpụrụ ya bụ Septemba 23 nke 2017). Mourinho kwuru sị na ọbụzị otu n'ime ndị nchịkọta na-akpa agwa ọfụma n'ime Premier League. "E kpebiela m na m ga-agba mbọ inweta ihe nrite a na-enye onye nchịkọta kacha kpaa agwa ọfụma n'ọgbọ egwuregwu, "A naghị m egwu egwu - akwadoro m onwe m, obi dị m ụtọ nke ukwuu. Atọhapụchabeghi m onwe m n'iwe oke iwe, ịchịkwa onwe m, n'ime otu egwuregwu. Ezuchaghị m oke. "Enwere ihe nrite buru ibu - onye kacha mee ọfụma n'izu, onye nchịkọta nke ọnwa, nke a na nke ọzọ - ha were otu nye onye kacha kpaa agwa ọfụma n'ọgbọ egwuregwu. Ha mekwaa ka ọ bụrụ refrii nke anọ ga-ebinyeaka. Obi kara m na aga m emeri."
[ "United Kingdom", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43024560
Ụgbọelu akụriela n´ụzọ Moscow
Mmadụ iri isii na abụọ si Moscow na-eje njem nwụrụ na mgberede ụgbọelu mere taa.
2018-02-11T13:36:50Z
Ụgbọelu dara n'ụzọ Russia egbuola ọtụtụ mmadụ
ụgbọelu Russia Udiri ụgbọelu dara Ozị na-eru BBC nti ugbua na-ekwu na ụgbọelụ ndị Russia e jị ebu ndị njem adaruola ala ihe dị ka kilomita iri asatọ ọ hapụchara Moscow. Ụgbọelu a bụ nke ndị Saratov anụ bụ An - 148 safuru n'ikuku ka ọ nọ n'ụzọ obodo a na-akpọ Orsk. Akọkụ ndị Interfax kwụrụ n'ụgbọelụ a kuririakuri n'obodo Argunovo nke bụ na onweghị onye a na-atuanya ịpụta na ya. Mmadụ isii ndị na-elekọta ya bụ ụgbọelụ anya so n'ime ya. Anyi ka ga ewetara ụnụ ozi maka ihe ma anyi nweta ya.
[ "Rọshia", "Mberede njem ụgbọelu" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43031392
Carvajal: Ka Neymar laa emumike
Dani Carvajal nke Real Madrid ekwuola uche ya n'ebe Neymar nọ maka asọmpi ha na ndị PSG.
2018-02-12T10:50:25Z
Dani Carvajal: Onweghi ọgwụ ga egbochi Neymar
Neymar siri otu bọọlụ Barcelona gawa PSG Neymar siri otu bọọlụ Barcelona gawa PSG Dịka a na-akwado igba asọmpi Eufa Champions nke agba iri na isii n'ime izuka a, ebe ndị Real Madrid ga-ezute ndị Paris Saint-Germain. Onye na-agbara Madrid bọọlụ bụ Dani Carvajal kwuru na onweghi "ọgwụ" nwereike igbochi Neymar, dịka ọ na-atụ anya ka Neymar laa ezụmike n'otu ụbọchị. Neymar dịka ihe iyi egwu nye ndị Madrid dịka ha na-aga izuta ndị PSG n'asọmpi ụkwụ nke mbụ. Carvajal, onye na-agaghị agba bọọlụ nke mbụ a si; "Mgbe gị na Neymar na-amaka bọọlụ, o nweghi ụdị ọgwụ ọbụla pụrụ igbochi ya emela nke ọma." Ọ sikwa ka ndị Madrid "Nwe olileanya ka ọ [Neymar] ghara ị nọ n'ụbọchị ọma ya" O kwuru na amabeghi onye ga-eme nke ọma n'asọmpi ahụ ga-adị n'etiti ndị otu abụọ ndị a.
[ "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/42884030
Agha iyi ndụ egwu ebibeghị
Nyocha BBC mere gbasara Mwakpo ndị Boko Haram na mpaghara ugwu Naịjịrịa
2018-02-12T16:42:21Z
Mwakpo ndị Boko Haram n'ọnụ ọgụgụ
Maiduguri dịna Naịjirịa bụ ebe agha kacha adaụda Maiduguri dịna Naịjirịa bụ ebe agha a kacha adaụda Onyeisiala Nịajirịa bụ Mohammadu Buhari ekwuola oge niile na emerịela ndị otu Boko Haram mana nyocha BBC mere n'egosi ihe dị iche Nyocha ndị BBC Monitoring gosiri na otu ahụ egbuola ndị mmadụ karịrị narị itoolu n'afọ 2017 karịa ndị ha gburu n'afọ 2016. Ha mere nwakpo n'esepughi aka n'ime afọ nke megidere ihe Buhari kwuru na asụpụla ha. Anyị achịkọtala ọnụọgụgụ ndịa n'ime mapụ nke na-egosi ụdị nwakpo Boko Haram na-eme, ebe ndị ha wakporo na ọnwa nke kachasị njọ Kedu ndị bụ Boko Haram? Boko Haram malitere ibuso Gọọmenti Naịjirịa agha n'afọ 2009 n'ebum n'obi ihiwe Islamic Caliphate na mpaghara ọdịda anyanwụ Afịrịka. Olekwasịrị anya na mpaghara ọwụwaanynwụ-ugwu nke Naịjirịa ebe ọgbaghara a gburula mmadụ puku narị abụọ, chụpụkwa ndị ruru nde abụọ n'ụlọ ha Maiduguri dịna Naịjirịa bụ ebe agha a kacha adaụda Boko Haram nke onyeisi ya bụ Abubakar Shekau kpọrọisi ala nye otu Islamic State (IS) na Maachị 2015 Boko Haram kewara n'ime otu dị icheiche n'ọgọsụtụ 2016 mgbe IS kwuru na ewepụla Shekau dịka onyeisi Otu ejiri gbakọọ ọnụọgụgụ Onye ntaakụkọ lekwasịrị anya na Naịjirịa bụ Andrew Walker gwara ndị BBC Monitoring na ọdịghị mfe ịgbakọ wakpo niile ha nwere maka ụdị ntaakụkọ ọdịnaala nke Naịjirịa BBC Monitoring nyochara akụkọ ndị ntaakụkọ ọdịnaala na nke ndị mba ndị ọzọ wepụtara maka nwakpo emere n'afọ 2016 na 2017 nke nyere nkọwa ụdị na ebe ndị Boko Haram wakporo Ọnụọgụgụnwakpo na-arị elu n'ọtu ebe Akụkọ kwuru na Boko Haram mere nwakpo dị otu narị na iri ise n'afọ 2017, nke karịrị ndị ha meburu n'afọ ndị gara-aga dị otu narị na iri abụọ na asaa Ebe ha mere nwakpo karịsịa n'ọnwa Jenụwarị, nke megidere ihe onyeisiala Buhari kwuru na ha nwụọla Mapụ Nwakpo Ndị otu a na-awakpo otu ebe kamgbe afọ abụọ gara-aga. Naịjirịa bụ ebe akacha wakpo n'afọ 2016 na 2017 dịka Borno Steeti bụ ebe nwakpo a bidoro. Mba Nijee nwetara nwakpo kachasị obere Ha wakporo mba ndị ọzọ dịka kameruun, Chadị na Nijee n'afọ 2017 Mapụ Nwakpo Mapụ nwakpo Usoro nwakpo Akụkọ kwuru na Boko Haram jịrị ngwaagha mee nwakpo iri itoolu, ebe ha jịrị ogbunigwe mgbagbuonwe wakpo ugboro iri ise na itoolu n'afọ 2017 Ebe nwakpo ha na mpaghara Kameruun na Chadị karịrị na ndị ha jiri nwaagha mee n'afọ 2016. Mapụ nwakpo Mapụ nwakpo N'ime ozi a, Naịjirịa nwetara nwakpo ejiri ogbunigwe mee dị iri na itoolu n'afọ 2016 na nke dị iri atọ na asatọ n'afọ 2017, ebe Kameruun nwetara ihe yiwere ya n'ọnụ ọgụgụ ogbunigwe mbagbu onwe karịrị na mpaghara Maiduguri nke Naịjirịa. Ọnụ ọgụgụ ndị egburu na-arị elu Ndị Boko Haram gburu ihe karịrị mmadụ narị itoolu na iri isii na asaa n'afọ 2017, nke karịrị mmadụ narị itoolu na iri n'afọ 2016. Ebe akacha gbue ndị mmadụ na Maiduguri n'afọ 2017 dịka ndị mmadụ agbala ọsọ ndụ Ebe ndị ọzọ egburu ndị mmadụ bụ n'ime obodo Magumeri, Konduga, Damaturu na Mubi Ọtụtụ ndị mmadụ Boko Haram gburu n'afọ 2016 na 2017 bụ ndị bi n'ime obodo n'akwa ndị agha Ndị Boko Haram na-aga n'ịhụ n'ịwakpo ụlọ ndị alakụba n'akwa ndị gbara ọsọ ihe ize ndụ (IDPs) Mapụ nwakpo Ihe jịkọtara Boko Haram na IS A matabeghị ihe jịkọtara Boko Haram na IS Nanị nwakpo iri na atọ n'ime nwakpo dị otu narị iri ise na otu bụ ihe ndị IS kwetara n'ọbụ ha mere Nke a nwere ike ị bụ maka agha ndị agha Sirịa na Ịraakị busoro ndị IS nke mere ha jiri gbafuo n'ebe ha kpọrọ ụlọ ha n'afọ 2017. Dịka otu ndị Boko Haram siri akpa agwa mere na IS enweghị ike ịkọrọ n'ọbụ mere ụfọdị nwakpo ha na-eme. Gịnị mere Boko Haram jiri esionwu? N'ime afọ anọ, ndị mmadụ akatọọla ndị isiagha naịjirịa maka akwadoghi ndị agha nkeoma ibuso ndị Boko Haram agha Nke a nwere ike igbanwe n'afọ 2018 dịka ndị mba Amerịka ekwetala iresi ndị Naịjirịa Ngwaagha Tupu oge ahụ eruo, otu a ka na-akpa ike na-iyi ndụ egwu dịka Tomi Oladipo onye ntaakụkọ BBC Afịrịka kwuru. Ndị agha Naịjirịa na-ahụsi anya n'ibuso ndị Boko Haram agha "Agbanyeghị okwu ndị Gọọmenti Naịjirịa n'ekwu na ha emeriela Boko Haram, ndị otu a ka na-awakpo na eyi ndụ ndị Naịjirịa bi na mpaghara ọwụwanynwụ ugwu n'akwa mpaghara Chadị" dịka o kwuru Oladipo kwuru na Boko Haram na-ezoezo nke mere o jiri dị ike n'ibu agha rute ugbua "N'ime ọtụtụ afọ ike ndịa nwere ịbata n'ime obodo soro ndị mmadụ biri n'akwa izo onwe ha n'ime obodo bụ ihe nyere ha aka n'ịkpa ike dị egwu" Oladipo kwuru.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43031905
A malitela ikpe ndị Boko Haram ikpe
A malitela ikpe ndị Boko Haram karịrị otu puku ikpe n'ụlọ ndị agha dị n'obodo Kaịnjị n'etiti Naịjirịa.
2018-02-12T16:44:51Z
A malitela ikpe ndị Boko Haram ikpe
Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Ụlọikpe ukwu nke Naịjira amalitela ikpe ndị Boko Haram ruru otu puku akpọchiri ọtụtụ afọ ikpe nke abụọ n'ụbọchị taa n'ọdọ ndị agha dịna Kaịnji, ebe a na-atụ anya na ha ga-awụcha nụlọikpe ọdịnala. Ndị ụlọikpe kwuru na a ga-ama ndị a ikpe n'ihu ọha dịka ndị otu na-ahụ maka ugwu ruru mmadụ n'akwa Amnesty International katọrọ ikpe nke mbụ. Ikpe nke a bụ nke kachasị n'ikpe a na-ama ndị na-eyị ndụ ekwu n'ala Naịjirịa. Ihe karịrị ndị ọkaịkpe anọ ga-ekpe ndị a ikpe n'ụlọ mkpọrọ ndị agha. Ihu foto ndị Boko Haram a na-achọ achọ A kwụsịrị ikpe n'ịme ọnwa anọ gara-aga, iji nye ohere ka ndị nchekwa mee nyocha gbasara ndị Boko Haram. dịka Mịnịstịrị na-ahụ maka ikpe ziriezi kwuru. N'ọnwa ọktoba 2017 bụ mgbe ikpe a malitere, amara mmadụ iri anọ na ise ikpe ị ga mkpọrọ afọ atọ rue afọ iri atọ na otu, ebe atọhapụrụ ihe karịrị mmadụ narị anọ maka nweghi ihe aka ebe megidere ha. A na-atụ anya ị ma kwa ọtụtụ ndị otu a ndịọzọ ikpe n'ọge n'abịa abịa. n Cheta na ndị Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009
[ "Boko Haram", "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43031981
A malitela ikpe ndị Boko Haram ikpe
A malitela ikpe ndị Boko haram karịrị otu puku ikpe n'ụlọ ndị agha dị n'obodo Kaịnjị n'etiti Naịjirịa.
2018-02-12T17:48:19Z
Ụlọikpe: Ndị Boko Haram ga-enweta ikpe ruru ha
Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Ụlọikpe ukwu nke Naịjira amalitela ikpe ndị Boko Haram ruru otu puku akpọchiri ọtụtụ afọ ikpe nke abụọ n'ụbọchị taa n'ọdọ ndị agha dịna Kaịnji, ebe a na-atụ anya na ha ga-awụcha nụlọikpe ọdịnala. Ndị ụlọikpe kwuru na a ga-ama ndị a ikpe n'ihu ọha dịka ndị otu na-ahụ maka ugwu ruru mmadụ n'akwa Amnesty International katọrọ ikpe nke mbụ. Ikpe nke a bụ nke kachasị n'ikpe a na-ama ndị na-eyị ndụ ekwu n'ala Naịjirịa. Ihe karịrị ndị ọkaịkpe anọ ga-ekpe ndị a ikpe n'ụlọ mkpọrọ ndị agha. Ihu foto ndị Boko Haram a na-achọ achọ A kwụsịrị ikpe n'ịme ọnwa anọ gara-aga, iji nye ohere ka ndị nchekwa mee nyocha gbasara ndị Boko Haram. dịka Mịnịstịrị na-ahụ maka ikpe ziriezi kwuru. N'ọnwa ọktoba 2017 bụ mgbe ikpe a malitere, amara mmadụ iri anọ na ise ikpe ị ga mkpọrọ afọ atọ rue afọ iri atọ na otu, ebe atọhapụrụ ihe karịrị mmadụ narị anọ maka nweghi ihe aka ebe megidere ha. A na-atụ anya ị ma kwa ọtụtụ ndị otu a ndịọzọ ikpe n'ọge n'abịa abịa. n Cheta na ndị Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009. Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009
[ "Boko Haram" ]
https://www.bbc.com/igbo/43042536
UEFA: Chekwa ugwu egwuregwu bọọlụ
Otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na Europe adọọla ndị na-egbu bọọlụ akanantị banyera ndị egwuregwu ike.
2018-02-13T17:58:34Z
UEFA: Chekwa ugwu egwuregwu bọọlụ
Uefa bụ otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na mba dịna Europe niile Uefa bụ otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na mba dịna Europe niile UEFA agwala ndị ogbu bọọlụ ka ha kpuchie ndị na-agba bọọlụ maka ihe oke imerụ ahụ site n'ịta onye ọbụla mere ihe nwereike imerụ mmadụ ahụ. Ha kwuru nke a site n'ihe nrụtụaka onye nchịkọta bọọlụ ndị Manchester City bụ Pep Guardiola ka ndị na-egbu bọọlụ chịkọta ya nkeọma mgbe e merụrụ onye bọọlụ ya bụ Leroy Sane ahụ n'ọnwa Jenụwarị. UEFA gwara ndị ogbu bọọlụ na ha nwere ọrụ ichekwa ugwu egwuregwu bọọlụ. "Anyị chọrọ ka ndị ọgba bọọlụ gbaa bọọlụ, ya mere a ga-echekwa ha nkeọma" dịka onyisi ndị ogbu bọọlụ bụ Pierluigi Collina kwuru. "Anyị achọghị i tinye ndụ onye bọọlụ ọbụla na nsogbu nihi mmerụ ahụ nke egwuregwuike kpatara ama ama mee maọbụ nke amaghị ama." Ndị ọgba bọọlụ kwesiri ịkwanyere onweghị ha ugwu.
[]
https://www.bbc.com/igbo/43068861
Ụmụakwụkwọ ruru 17 anwụọla n'Amerịka
Otu onye bụ egbe gara n'ụlọakwụkwọ dị na obodo Florida n'Amerịka gbagbuo ụmụakwụkwọ.
2018-02-15T06:25:37Z
Ụmụakwụkwọ ruru 17 anwụọla n'Amerịka
Ọtụtụ ndị ụmụakwụkwo na nne na nna ha Mwakpo egbe aha bidoro ebe elekere abụọ n'ehihe unyaahụ Otu nwata akwụkwọ akwụsiri akwụkwo n'ike agbaguola ụmụakwụkwọ ibe ya na ụlọakwụkwọ Marjory Stoneman Douglas na Florida. Akụkọ sị na ụmụakwụkwọ ndị fọrọ zoro onwe ha n'ime mpịo nkụzị ha ka mwakpo a na-eme. A nwụchiri onye ọgba egbe nke ahụ, onye nke e nyere aha ya dịka 'Nikolas Cruz', nwata gbara afọ iri n'itoolu. A hụru ọtụtụ egbe ndị ọzọ o ji. Ụmụakwụkwo na ọtụtụ ndị nkuzi ha so na ndị nwụrụ, ebe mmadụ ruru iri na anọ na-anara ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ maka mgbọ metụtara ha. Otu onye ibe Cruz si na ọ bụ onye ọ na-ahịa ahụ ijideta iwe ya. Ka nke a mechara, ndị nne na nna cheruru mgbede, ihe ruru elekere asaa iji mata ma ụmụ ha anwụrụ anwụ ka ha adịndụ. Anwụchiri Cruz, onye mere ihe nke a, ka ọ nọ n'akụkụ ụlọ akwụkwo ahụ. Ndị uweoji kwuru na ụfọdụ ndị ụmụakwụkwọ ma onye obụ mgbe mwakpo ahụ na-aga. Otu onye ibe ya n'ụlọ akwụkwọ ahụ sị na a ma nwata ahụ bụ Cruz, ama dịka onye na-ekwu okwu egbe mgbe niile. Nke a bụ ugboro iri na asato a na-enwe mwakpo egbe n'ụlọakwụkwo Amerịka n'afọ a. Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya n'elu igwe okwu Twitter:
[ "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/43071951
Ndị uweojii egbuola Augustine Agulegbu
Ndị uwe ojii gbagburu Augustine Agulegbu na Delta Steeti ebe a nwaporo ya.
2018-02-15T12:15:01Z
Don Waney: Ndị uweojii agbagbuola onye ntọ na Delta
Ndị uweojii Naijiria Ndị uweojii na-achọ ọtụtụ ndị ntọ ndị ọzọ Ndị uweojii na Delta steeti egbuola otu onye a na-ebo ebubo na ọ bụ onye ntọ aha ya bụ Augustine Agulegbu. Ha kwuru na Augustine Agulegbu bụ otu n'ime ndị otu Don Waney bụkwa onye ndị uweojii gbaburu n'ọnwa Janụwarị n'afọ nke a. Ndị nche obodo pụrụiche bụ Department of State Services n'olu bekee kwuru na ha wakporo Agulegbu na New Sapela Road n'ime Delta steeti ebe a gbagburu ya. DSS kwukwara na onye ọzọ ha na achọ ugbua bụ otu nwoke akpọrọ Emenike. Emenike bụ otu n'ime ndị Gọvanọ Rochas Okorocha mmere mgbaghara. Evans bụ onye ntọ mmadụ tọrọ ọtụtụ mmadụ Nke a ọ ga-ebute udo? Otu nwoke bi na Delta steeti aha ya bụ Ted Ugbovo gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ogbugbu ha gburu Augustine Agulegbunjọ enweghị ihe ọpụtara. Ted kwuru: "Ndị uweojii na-egbu ndị ntọ mmadụ oge niile, mana ndị otu ha na-emechekwa mmalite ọrụ ha. Nke a bụ maka ọrụ adighị n'ala anyị." O kwukwara na "Cheta na e ji Evans na Lagos, mana ọ kwụsịrị ntọ mmadụ? ihe ndị uwe ojii kwesịrị ime bụ ị kwalite nchekwube ndị mmadụ nwere n'ala Naijịrịa. Ọ bụghị ị me mkpọtụ na ha gburu otu onye ntọ" Evans na ndị ntọ ndị ọzọ Ugbu a, Evans na-aza ọnụ ya n'ụlọ ikpe n'Lagos. O nwere ike ị ga nga ebebe maọbụ na ikpe maa ya. DSS na-ekwe nkwa na ndị ntọ niile nọ n'ala Naijịria anaghị enwe ezumike.
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii" ]
https://www.bbc.com/igbo/akuko-ndi-ozo-43073984
Aka akparala dibia na-atụ mgbere ahia ụmụaka
Otu na-ahụ maka imegide ndị na-atụ mgbere ahịa ụmụaka akpọrọ NAPTIP anwụchiela otu dibia.
2018-02-15T14:03:41Z
NAPTIP akpọchiela otu ebe a na-atụ mgbere ụmụaka
Nwaanyị na-eney nwa ara Ịtụ mgbere ahịa ụmụaka agbalitela n'ala ọwụwa anyanwụ Naijirịa Otu na-ahu maka imegide ndi na-atụ mgbere ahia a kpọrọ NAPTIP na aha ịchafụ, anụchiela otu dibịa otụmọkpọ na-atu mgbere ahia ụmụaka. Ụmụnwaanyị ndị ihe dị ọsịsọ na-achọ imụ nwa na-agakwuru ya ka o nye ha nwa. Itụ mgbere ahia ụmụaka aghọla nnukwụ ahịa na-amụtara ndị nọ n'ime ya ọtụtụ nde naira. NAPTIP kpọchikwara ụlọọgwu ọdịnala akụkọ kwuru na dibia ọtụmọkpọ ahụ ji atụ mgbere ahịa ụmụaka. Josiah Emerole bụ ọnụ na-ekwuchitere NAPTIP gwara BBC na a nwụchịrị otụ dibia mgbọrọgwụ na-atụ mgbere ahịa ụmụaka n'Abuja. O kwukwara na akụkọ kwuru na ndị ụweojii nwụchiri otu nwaanyị enwudere na Dịsemba kụ nwa amụrụ ọhụrụ. "Nwaanyị ahụ kuru nwa ahụ si Abuja na-aga Niger steeti,mgbe e nwudere ya o nweghị ike ikọwa ka ya bụ nwa siri baa ya aka.Ndị uweojii were ya bụ ikpe nyefee ndị NAPTIP. Kemgbe ahụ anyị na-esochi ya bụ dibịa na-atụ mgbere ahịa ụmụaka anya rue izuụka abụọ gara aga mgbe anyị nwuchịrị ya. "Mgbe anyi nwuchiri ya bụ dibịa anyi chọpụtara ọtụtụ ọgwụ mgbọrọgwu oji arụ ọrụ na be ya. Nwaanyị ahụ anwụchirị enwerela onwe ya mana NAPTIP nara ya nwa ahụ nyefee n'aka ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka ana-emegbu emegbu nke Federal Mịnịstrị FCT. kedu ka ha siri chọpụta na dibia a na-atụ mgbere ụmụaka? Emerole kwuru na nwaanyi ahụ kọwapụtara na onweghi afọ ime ha kpụrụ. Na ya bụ dibia na-enye ha ọgwụ na-eme ka ha dị ime. Orue mgbe ha ga-amụ nwa dịka ndi ụwa chere,dibịa ahu ekuru nwa kunye ha. Emerole gara n'ihu kwuo: "Anyi na-enyocha ihe nwaanyi a kwuru ka anyi mara ebe ya bụ dibia si ekute ụmụaka ọ na-ekunye ụmụnwaanyị ndị a." Itu mgbere ụmụaka agbalitela nso nso a n'ọwụwa anyanwụ Naijịrịa.Ọfọdụ ka anwuchịgoro,ọfọdu ka nọ n'ọsọ.
[ "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43085115
Isi Shekaụ: Nde naira 3 bụ iji ụkwụ ụkpana tajie eze
Ndị Naịjirịa ekwuola na nde naịra atọ e kwuru na a ga-enye onye ga-agba ama ebe Shekaụ nọ dị obere.
2018-02-16T15:31:44Z
Isi Shekaụ: Nde naira 3 bụ iji ụkwụ ụkpana tajie eze
Ugboro ugboro ka ndị agha kwuru na ha egbuola Shekau Onye ọkacha mara n'okwu nchekwa bụ Adetunji Ajayi, kwuru na nde atọ nke bụ ego ndị agha kwere na nkwa na ha ga-akwụ onye mgbaama ga-agwa ha ebe onyendu ndị Boko Haram bụ Abubakar Shekau nọ bụ ihe na-atọ ọchị. Ụnyaahụ ndị agha Naijirịa kwuru na ha ga-enye onye ọbụla nwere akụkọ maọbụ ga-agba ama ga-enye aka ịnwụchi onyendu ndị Boko Haram bụ Abubakar Shekau, nde naịra atọ (N3m). Ajayi onye bụbụ onyeisi agha sị: "Ndị agha anyị na-akpa ọchị." "Ikekwa, ha ma ebe Shekau nọ, mana ha chọrọ ka ndị nọ ya nso rapụta ya. Ego ha kwuru na ha ga-enye pere oke mpe mmadụ ịbịa tufuo ndụ ya. O kwesiri iru nde naira 50 n'ihi na onye ọbụla ga-enye ụdị ozi ahụ nwere ike ịnwụ. O kwesịrị inye ya ego ga-ezuru ya ịgbapụ ọsọ laa mba ọzọ." Nwunye dibia Boko Haram achịliela aka elu Agha iyi ndụ egwu ebibeghị Ọtụtụ ndị mmadụ kwụnyere n'ihe Ajayi kwuru. Onye ọkammụta na-arụ na National Defence College, Nigeria, bụ Nnamdị Obasi kwuru sị: "Ọ pụtara na Shekau na-ada n'ọnụ ahịa? N'ọnwa Novemba afọ 2012, gọọmenti Naijiria kwuru na ha ga-enye nde naira 290. N'ọnwa Juun afọ 2013, gọọmenti US kwuru nde dọla 7. Ụnyaahụ Ndị agha Naijiria ekwuo nde naira 3." Mana dọkịta Freedom Onuoha, bụ ọkammụta n'ihe gbasara nchekwa ma bụrụkwa onye nkuzi nke Political Science na University of Nigeria Nsukka, kwuru na nkwa ego ahụ zuru ikpalite mụọ ndị nwere ozi maka otu a ga-esi nwụchie Shekau. "Ọ bụ iji kpalite obi ndị mmadụ inye ozi ga-enye aka ka e jide ya na ndụ." "Egbuola ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya. Shekau esizighị ike dịka ọ dị na mbụ. Ọzọ, ọtụtụ ndị Shekau gburu ndị ezinaụlọ ha ga-eji iwe ya na-achọ ụzọ ha ga-esi kwụọ ya ụgwọ. Ha ga-ahụ ya dịka ezi ohere. Nde naira atọ ahụ ga-abụrụ ha ihe mgbakwụnye." Lee ihe ndị ọzọ na-ekwu n'igwe okwu Twitter:
[ "Boko Haram", "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii" ]
https://www.bbc.com/igbo/43085667
Ezigala Mịnịsta nchekwa obodo Zamfara
Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ezigala minista na-ahụ maka nchekwa Zamfara steeti.
2018-02-16T16:40:55Z
Buhari: Minista na ahụ maka nchekwa gawa Zamfara.
Muhammadu Buhari Buhari akatọọla oke ogbugbu narala mmadu iri atọ na ise ndụ na Zamfara Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ezigala minista na-ahụ maka nchekwa akpọrọ Mansur Dan-Ali na Zamfara steeti, ka ọ ga-nyochaa etu ihe si kwụrụ n'obodo Birane dị n'okpuru ọchịchị steeti ahụ ebe e gburu mmadụ iri atọ na ise ụnyahụ. Onye na-ekwuchitere onyeisiala n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu, kwuputere ihe a n'akwụkwọ ozi o wepụtaara ndị ntaakụkọ. Shehu kwuru na minista ahụ kwesịrị inyocha ọnọdụ a ma wetakwara Buhari ozi ozugbo, ebe o kwuru na ọ katọrọ ya bụ oke ogbugbu. O kwukwara na Buhari enyela iwu ka ndị nche ala Naijirịa ziga ndị ọrụ ha ebe ihe mberede a mere ma nwụchie ndị omekome kpara arụ a. Shehu kwusirike na Buhari na-agba mbọ n'ihụ na oke ogbugbu a na-eme n'akụkụ dị icheiche na Naijirịa kwusịrị. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru, "Onyeisiala nwere nnukwu mwute ebe ezinaụlọ ndị egburu n' oke ogbugbu a nke merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ. Ọ na-ayọ Chukwu ka ọ kasie ndị nọ n'iru uju obi."
[ "Zamfara Steeti", "Naijiria", "Benue steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43085670
Anwụchiela ndị Russia 13 kpatọsiri aka
Anwụchiela ndị Russia ruru iri na atọ maka aka ha kpatọsiri na mbinye aka US mere n'arọ 2016.
2018-02-16T20:21:03Z
Elekshion US 2016: Anwụchiela ndị Russia kpatọsiri aka
Flag America Mbinye aka emere na US n'arọ 2016 wetere ọtụtụ ndọrọndọrọ. Anwụchiela ndị Russia ruru iri atọ maka aka ha kpatọsiri na mbinye aka US mere n'arọ 2016,nke a chọpụtara na nyocha FBI. Mmadụ na atọ akpọrọ aha ka eboro ebubo ikpa nkata mpu ekwenti akpọrọ 'wire fraud' n'olu oyibo. Onye kwupụtara ihe a bụ onye ọkaiwu Robert Mueller,onye nke na-enyocha nkpatọsị aka ndị Russia. Ụlọọrụ atọ dị na Russia so na nrụrụaka. Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu,osote ọkaịwu akpọrọ Rod Rosenstein kwuru na onweghị ebubo na onye mba Amerika so na ihe nrụrụaka a maọbụ ebubo gosiri na nkpatọsịaka a mebiri ihe mbinye aka US elekshion 2016 pụtara. Mana o kwuru na akwụkwọ ruru pejii iri atọ na asaa gosiri na ndị Russia chọrọ ikụnye mkpụrụ nhasa na mba Amerika. kedu ihe ebubo a putara? Ebubo a kwuru na ụfọdụ ndị eboro ebubo ji kọmputa na US we zoo na ihe omume ha si na Russia. okwukwara na ndị a eboro ebubo jiri aghụghọ gbanwe ọnọdu ha dika ndị si na mba US,mepe pejii n'igwe okwu ọhụrụ ka ha we dọta ndị mba US. Ha mepekwara ma na-elebanya na ọtụtụ igwe okwu twita edoziri ka ọ dika ọbụ ndi US na hazi ya.
[ "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43095861
Federer abụrụla onye mbụ kacha kaa nka na tennis
N'agbanyeghị na afọ iri na anọ agaala kamgbe o ji ruo ọkwa nke mbụ na tenis, Roger Federer emeela ya ọzọ.
2018-02-17T10:53:44Z
Federer abụrụla onye mbụ kacha kaa nka na tennis
Roger Federer Roger Federer bidoro iji tenis mere akaọrụ n'afọ 1998, oge ọ dị afọ iri na asaa Roger Federer ekwuola sị na ịbụ onye kacha kaa nka bụ onye mbụ n'ọkwa a na-agaghị echefu echefu n'egwuregwu tenis - afọ iri na anọ kemgbe o ruru n'ọkwa ahụ mbụ - bụ "atụmanya m bịara na mmezu". Federer dị afọ iri atọ na isii, ji 4-6 6-1 6-1 merie Robin Haase n'ime agba nke asatọ n'ime asọmpi Rotterdam Open, nke mere o ji nọchie Rafael Nadal dị afọ iri atọ na otu, n'elu ọkwa. Ọ gafekwara Serena Williams, onye dị afọ iri atọ na ise oge ọ dapụrụ n'ọkwa mbụ nke ụmụnwaanyị n'ọnwa May 2017. Federer kwuru,"Nke a kacha bụrụ ihe nye m n'afọ iri atọ na isii, fọrọ ntakịrị ka o ruo iri atọ na asaa." "Ị kawa nka, ị ga-etinyekwu uchu n'ọrụ karịa etu isi emebu mbụ. Ị ga-agba mgba ịnapụta ya onye rụsiri ọrụ ike irute ebe ahụ. "Ịbụ onye mbụ bụ mmezu ebumnobi onye ọbụla na-apịa tenis. Ọ bụ ihe ịtụnanya inweta ya. Inweta ya ebe a bụ ebe m nọ nweta ohere m nke mbụ, kachasị bụrụ ihe nye m." Federer bu ụzọ ruo onye mbụ n'ọkwa tenis n'ọnwa Febrụwarị 2004, mana ọ kwụsịrị ibụ mbụ n'ọkwa na Oktoba 2012 ma gbadaruo iri na asaa na Jenụwarị 2017. N'agbanyeghị ya, o buliri iko asatọ gụnyere Wimbledon na Australian Open abụọ kemgbe ahụ.
[ "Egwuruegwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43095406
'Gaanụ tinye aha n'akwụkwọ ntuliaka'
Ndị otu Massob akpọọla ndị Igbo oku sị ha gbaa mbọ hụ na ha tinyere aha ha n'akwụkwọ maka ntuliaka.
2018-02-17T10:56:46Z
Massob: Gaanụ tinye aha unu n'akwụkwọ ntuliaka
Eastern Nigeria Map N'akwụkwọ ozi nke Ugwuoke Ibem Ugwuoke, onye odeakwụkwọ nke otu Massob binyere aka, ha kwuru ka ndị otu ha niile nọ n'ala Naịjirịa gbaa mbọ ga-tinye aha ha n'akwụkwọ ntuliaka ma nweta Permanent Voters Card n'ebe ndị INEC wepụtara maka ndebanye aha ka a ghara inwe mgaramara. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru sị: "Akwụkwọ ntụliaka Naịjirịa abụghị sọọsọ maka mbinyeakanakwụkwọ nke Naijiria, mana ọ ga-abụ ihe a ga-eji tinye aka ime ntuliaka referendụm maka nwereonwe Biafra." Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na erubeghị isi na idebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka bụ mmadụ iji aka ya merụọ onwe ya ahụ nke nwere ike imebi mbọ inweta mnwereonwe Biafra. "Maka inweta Biafra nke United Nations ga-akwado, ọ bụ ndị tinyere aha ha maka ntuliaka na Naijiria." Ihe mmụta si na census gara aga Na nkọwa ya, onye mgbasa ozi Massob bụ Comrade Edeson Samuel gwara onye ntaakụkọ BBC sị: "Anyị matara na voters card dị mkpa nye onye ọbula bụ Biafra n'ihi na ọ bụ sọ onye nwere ya ga esonye ime referadum maka Biafra. Comrade Samuel dọrọ ndị Igbo aka na nti ka ha gba mbọ hụ n'ụkwụ ha zọhiere oge gara aga, mgbe ha juru itinye aha ha maka ịnata akwụkwọ ntuliaka na isonye na ọnụọgụgụ nke a kpọrọ census na bekee, ọzọ. Ọ sịrị na agwa ahụ mechara ghọọ mmadụ iji aka ya gbuo onwe ya. "Ihe ndị a mere ka ndị Igbo pekarịa n'ọnụọgụgụ, ebe anyị ma na ọnụọgụgụ ndị Igbo karịrị." Cheta na ụnyaahụ na INEC kwuru na ndị si n'ọwụwa anyanwụ so na ndị pekarịchara mpe na ndị tinyegoro aha ha n'akwụkwọ ha.
[]
https://www.bbc.com/igbo/43095862
Ogbunigwe egbuola ihe karịrị mmadụ 17
Ndị oji-ogbunigwe-agbagbu-onwe abụọ egbuola mmadụ 17 na Borno steeti.
2018-02-17T12:41:45Z
Na Borno, ogbunigwe egbuola ihe karịrị mmadụ 17
Obodo Konduga Ndị oji-ogbunigwe-agbagbu-onwe abụọ egbuola ihe karịrị mmadụ iri na asaa ma merụọ iri ise ahụ n'ime otu ahịa n'obodo Konduga dị na Borno steeti. Ha wakporo ahịa azụ na-ekwo ekwo n'obodo Konduga nke dị nso na ndịda Maiduguri. Ndị hụrụ ka o si mee kwuru na mkpamkpa a dị ezigbo egwu, ebe ndị ọrụ gbatagbata na Borno steeti kwuru sị na ndị mgbagbuonwe abụọ ahụ sokwa na ndị nwụrụ. Is'haq Khalid bụ onye ntaakụkọ BBC na-akọwa na na-agbanyeghị na onwebeghị onye kwuru na ọ bụ ha kpara mkpamkpa a, ka o siri mee na-arụ aka na ọ bụ akaọrụ ndị Boko Haram na-enye nsogbu na mpaghara ahụ. Ebugala ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ.
[ "Boko Haram", "Borno steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-43102417
Ụgbọelu bu mmadụ 60 akpọkasịala
Ihe mberede a mere nso obodo Semirom dị na mpaghara Isfahan na mba Iran.
2018-02-18T09:19:38Z
Ụgbọelu bu mmadụ 60 akpọkasịala na Iran
Ụgbọelu ndị Aseman Airlines Aseman Airlines na-elekọta ụgbọelu ATR 72-500 Ụgbọelu bu ihe ruru mmadụ 16 a kpọkasịala n'ebe ugwu dị na sentral Iran, dịka ntaakụkọ kwuru. Ụgbọelu a dara n'ugwu Zagros dị nso obodo Semirom dị na mpaghara Isfahan, ka ọ na-efe n'etiti Tehran na ọdịda-anyanwụ obodo Yasuj, dịka akụkọ kwuru. "Ndị ọrụ gbatagbata niile mụ anya na-eche" otu ọnụ na-ekwuchitere ndị ọrụ gbatagbata kwuru. "Ụgbọelu ahụ bu ndị njem ruru 50 maọbụ 60." Akụkọ kwuru sị na ọ bụ ihuigwe ọjọọ gbochiri helịkọpta ndị gbatagbata ịgaru ebe ahụ. Ọ bụ ndị Aseman Airlines nwe ụgbọelu ahụ a sị na ọ bụ ATR 72-500. Akụkọ kwuru sị na ndị njem 60, ndị nchekwa abụọ, ndị na-elekọta ndị njem n'ụgbọelu abụọ nakwa mmadụ abụọ na-anya ụgbọelu. Mmadụ niile nọ na ụgbọelu a anwụrụ.
[ "Iran", "Mberede njem ụgbọelu" ]
https://www.bbc.com/igbo/43105673
A tọghapụla ndi agha Boko haram 475
Ụlọ ikpe dị na Niger steetị kwuru na ha tọghapuru ha makana ndị agha Naijiria wepuru ihe akeebe.
2018-02-18T18:47:53Z
Ndi agha Boko haram 475 enwerela onwe ha
Ndị agha Boko Haram Boko Haram kwuru na nkuzi bekee bụ arụ Ụlọ ikpe dị na Kainji na Niger steetị ekwuola na ha hapụla mmadụ narị anọ, iri asa na ise, bụ ndị a na-ebo na ha so na ndị agha Boko Haram. Ụlọ ikpe a kwuru na ha ga-enwogharị ha ka ha bụ ndị nwere emume ọhụrụ n'ala Naijiria. Onye oka iwu n'ikpe ha kwukwara na ha ewepụla ebubo kwuru na ha bụ ndị agha Boko Haram. Ndị agha ala Naịjirịa ji ndị a na mkpọrọ dị iche iche n'ugwu hausa, mgbe Boko haram na-ebuso ha agha. Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram ka kwụ chim chim Ufọdụ n'ime ha nọrọ na mkpọrọ ka mgbe afọ 2010. Ụlọikpe kwuru na ha hapụrụ ha makana ndi uweojii enweghị ike iweputa ihe akaebe. Abubakar Malami bụ oka ikpe ukwu ala Naịjirịa gwara BBC na ndị a ha gbapụtara ga-ahụ ezinaụlọ ha mgbe a hazịchara ha ọfụma. Ugbu a, otụtụ puku ndị agha Boko Haram na-aza ikpe n'uloikpe dị na Kainji na Niger steeti.
[ "Naijiria", "Ntọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43093220
Nwunye Kanu: A gaghị ekwe ka Ndigbo chịa
Nwunye Nnamdi Kanu ekwuola na kemgbe ndị agha gbachara Egwu Eke, na ya ahụbeghị di ya.
2018-02-19T04:04:37Z
Nwunye Nnamdi Kanu: Gọọmenti Buhari tọhapụrụ m dim
A gwala Gọọmenti Naịjirịa ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onye ndu ndị otu na-achọ mnwereonwe bụ Indigenous People of Biafra (Ipob). Isi ụlọọrụ nchekwa ala Naịjirịa kwupụtara na Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe maka ebubo nnupụisi megide Naịjirịa na-efu efu n'ọnwa Seputemba afọ 2017. N'ajụjụọnụ pụrụ iche ndị ntaakụkọ BBC Igbo gbara nwunye ya bụ Uchechi Kanu, O boro Gọọmenti Naịjirịa ebubo na ha mara ebe di ya nọ. Agbanyeghị na ndị agha Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị ha ji Nnamdi Kanu. Ndị mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim na Chimezie Ucheagbo.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Nnamdi Kanu", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43102332
Pete Edochie gọrọ BBC Igbo ọjị
Edochie sị na ọjị putara: Omenala Jikọrọ Igbo, ya mere BBC Igbo jiri ga ka ọ goro anyị oji iji.
2018-02-19T04:06:26Z
Edochie si na ọjị bụ ihe eji anabata ndi obịa
Ịgọ ọjị ma ọbụ ikpe ekpere ọjị bụ nnukwu emume ndị Igbo na-eme. Onye Igbo ọ bụla kwenyere na ọjị bụ ihe eji anabata ndị obịa na omenala Igbo. Pete Edochie kọwara na nkọwa ihe ọjị putara bụ: Ọ - Omenala, J - Jikọrọ, I - Igbo. Nke a mere BBC Igbo jiri ga n'ulo ya bụ nnukwu onye echichi ka ọ goro anyị oji iji were mepee ngalaba ntaakụkọ ọhụ bụ BBC Igbo service. Nkata anyi na Pete Edochie ga na abịara unu na nkeji na nkeji.
[ "Naijiria", "Omenala" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43101334
Soyinka: Ndị okenye kwesiri ị ga zuo ike
Onye ọkammụta gbapụtara ihe na Naịjirịa bụ Wole Soyinka ekwuola na ndị ntoroọbịa ka nwere ohere ịchị.
2018-02-19T04:20:51Z
Wole Soyinka: Chịkọta onwe unu ọnụ ka ndị okenye zuo ike
Ọkammụta Wole Soyinka kwuru na ọ bụrụ na ndị ntoroọbịa Naịjirịa chịkọta onwe ha ọnụ ma họpụta otu onye n'ime ha, na ha nwereike iwere oche ọchịchị Naịjịria. O kwuru nke a mgbe ndị ntaakụkọ BBC gbara ya ajụjụ ọnụ banyere ohere dịrị ndị ntoroọbịa ịchị Naịjịrịa.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43110008
Chụaranụ Naịjirịa aja - Buhari
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari agwala ndị ọnụ na-eru n'okwu ka chụọrọ Naijirịa aja.
2018-02-19T14:31:24Z
Buhari: Kedu ka Ị ga-esi nyere Naijiria aka?
Muhammadu Buhari Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari, akpọkuola ndị Naịjirịa niile, ọkachasị ndi ọnụ na-eru n'okwu, ka ha dị nkwado ichụ aja nke ga-enye aka mee ka Naịjiria too. Buhari kwuru okwu a na Daura n'ụbọchị ụka mgbe ya na ndị a kpọrọ "Katsina Senior Citizens" nwere nzukọ. Ọ gakwara n'ihu wee kwuo na ndụ mba ọbụla, a na-enwe mgbe ndị mmadụ kwesiri ịchụ aja ma ha chọ ka obodo ga n'ihu. Onyeisiala gwara ndị otu ndị gọvanọ nke a kpọrọ "Governors Forum" na bekee nke Gọvanọ Katsina steeti bụ Aminu Masari duru bịa si: "Naịjiria nke oge anyị chọrọ ka ndị be anyi niile were gbaputa ya n'ime mpụ na aghụghọ, ọkpa na-agaghi n'iru." Akụkọ ndị ga-amasị gị: Nwunye Nnamdi Kanu: Amaghị m ebe di m nọ Soyinka: Ndị okenye kwesiri ị ga zuo ike Iceland amachiela ibe nwoke ugwu Buhari kwere otu ndị gọvanọ nkwa na nchekwa mmadụ na akụnụba ndị Naịjirịa niile ga na-enweta mgbado anya ya ọfụma. Ka ọ na-asa ya, Govanọ Masari sị na ndi otu ya bịara be Buhari mgbaru maka mmadụ abụọ nwụrụ na be ya. Ha kenekwara onyeisiala maka mberede okporoụzọ metụtara nwa ya nwoke bụ Yusuf.
[ "Katsina steeti", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/43121132
Okpalaeke etinyela akwụkwọ arụkwaghịm
Bishop Okpaleke nke Ahiara Catholic Diocese etinyela akwụkwọ arụkwaghim, ebe Pope kwadoro ya.
2018-02-20T05:38:50Z
Ahiara Diocese: Okpalaeke etinyela akwụkwọ arụkwaghịm
Pope Francis Pope Francis anabatala akwụkwọ arụkwaghịm Bishop Okpaleke tinyere Bishop Peter Okpaleke nke Ahiara Catholic Diocese etinyela akwụkwọ arụkwaghịm, ebe Monsignor Lucius Iwejuru Ugorji ga-anọchi ya dịka onye ga na-achị diocese obere oge. Akwụkwọ arụkwaghịm a na-abia ka ọnwa ole na ole gachara mgbe Vatican ji nye iwu ka ndị ụkọchukwu nke Diocese Ahiara họrọ ịnabata Okpalaeke dịka Bishọp maọbụ ịhapụ ọrụ ha dịka ndị ụkọchụkwụ Katọlik. A na-atụ uche na mkpebi Vatican nwere banyere ikwunye ka ndị mmadụ jụ ụkọchụkwụ ha-achọghị ga-ebute ọgbaghara ebe ndị ọzọ ụka Katolic gbanyere mgbọrọgwụ. Ụka Anglịkan: Kwụsị njem ahụike 'Gbagharanụ arụ na-eme n'ụlọ ụka' - Pope Francis 'Buhari gbara nkiti ihe na-emebi' Na mkparitaụka ya na onye ntakụkọ BBC nwere, otu ụkọchụkwụ Katolik ọnụ na-eru n'okwu bụ Monsignor Bernard Okodua, kwetara na ọ bụ eziokwu. Okodua onye bụ Dean Mainland Deanery nke Catholic Archidiocese nke Lagos sị: "Anyị nụrụ na Bishop Okpaleke tinyere akwụkwọ arụkwaghịm na nzukọ ndi Bishọp Naijirịa nke na-aga n'ihu ugbua. Anyị amaghị ihe ga-eso akwụkwọ ahụ o tinyere. Anyị na-eche ka anyị mara ihe ndị bishọp na-eme nzukọ ga-ekwụ maka ya." Ndị ụkọchukwu ndị Catọlik na-anata okike site na Rome Pope ochie bụ Pope Benedict XVI bụ onye họpụtara Okpaleke dịka Katolik Bishop nke Ahiara Diocese na afọ 2012, mana ndị ụkọchukwu nọ na mpaghara ahụ jụrụ ya ma kpalite ọgbaghara megide ya. Ndị Ahiara Catholic Diocese ndị bụ ndị mpaghara Mbaise jụrụ ịnabata Okpaleke onye bụ onye Anambra steeti n'ihi na ọ bụghị onye be ha, ha gara n'ihu gbachie ụlọ kathedral ebe ekwesịrị ichi ya bishop nke mere ka anọrọ ebe ọzọ mee emume ahụ. Kamgbe ahụ tigbuo-zogbuo so esemokwu ahụ ekeweghị ka ụkọchụkwụ ahụ rụọ ọrụ ya nke wetara iwu ahụ enyere ka ụkọchukwu niile tinye aka n'akwụkwọ kwe nkwa irubere Okpaleke isi maọbụ kwụsị ọrụ dịka ụkọchukwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Nwunye Nnamdi Kanu: Amaghị m ebe di m nọ Soyinka: Ndị okenye kwesiri ị ga zuo ike Iceland amachiela ibe nwoke ugwu
[ "Naijiria", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43121804
'Ndụ m gba ọtọ maka di m anọghị ya'
Uchechi Kanu nwunye Nnamdị Kanụ bụ onyeisi ndị Ipob na-ebe akwa dị ya.
2018-02-20T06:24:32Z
Nwunye Nnamdị Kanụ: Ndụ m gba ọtọ maka di m anọghị ya
Uchechi Kanụ gwara BBC Igbo na ụmụ ya na-ajụ ese nna ha. Ọ sị na ọ na-ara ya ahụ ilekọta ụmụ ha. Ọ sị ka dị ya kasie obi ya. Ndị mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim na Chimezie Ucheagbo.
[ "Naijiria", "Nnamdi Kanu", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43128529
A dọtịala ikpe ndị Ipob
Ọkaiwu Binta Nyako tinyere ụbọchị 20 ruo 22 ka alaghachite maka okwu Nnamdị Kanu na mmadụ atọ ndị ọzọ.
2018-02-20T13:30:15Z
Ọkaiwu Binta Nyako Adọtịala ikpe ndị Ipob
Ndị Ipob Ndị Ipob na-achọ ka ekwa Naịjirịa N'ụlọikpe ukwu nke dị n'Abuja, ọkaiwu Binta Nyako dọtiri ikpe ndị otu Ipob ebidoro kamgbe 2015. Akụkọ sitere n'aka Emma Powerful bụ onye na-ekwuchitere ndị Ipob na-akọwa na ọ bụ onye ọkaikpe sinetọ na-anọchite anya ndị Abia Saụt Sinetọrịal bụ Enyinnaya Abaribe, tinyere akwụkwọ ka-adọtia ikpe a. Mana onye ntaakụkọ nọ n'ụlọikpe a gwara BBC Igbo na ọ bụ ọkaikpe nke gọọmenti Naịjirịa sị ka ọkaiwu Nyako wepu okwu Nnamdi Kanu site n'ime nke ndị otu ya. Onye ntaakụkọ gwara anyị na ọkaiwu kwetere, wee dọtịa ikpe a, weruo ya ụbọchi 20 na 22 n'onwa Maachị nke afọ a. Cheta na Benjamin Madubugwu, David Nwawuisi, Bright Chimezie Ishinwa, Chidiebere Onwudiwe na ndị ọzọ na-aza azịza maka ebubo gọọmenti Naịjirịa boro ha maka nkewa ha sị ka-ekewa Naịjirịa wee nye ha mba Biafra. Powerful na-atụ aka na ọ bụ gọọmentị Naịjirịa mere ihe e ji dọtịa ikpe a, ma na a na-asị na ọ bụ ha mere ka Sinetọ Abaribe chọọ ndọtị ikpe a. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Nwunye Nnamdi Kanu: Amaghị m ebe di m nọ Soyinka: Ndị okenye kwesiri ị ga zuo ike Iceland amachiela ibe nwoke ugwu
[ "Naijiria", "Nnamdi Kanu", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43130440
Gini ga-eme ka i ree nwa ị mụrụ ọhụrụ?
Akụkọ na-ekwu na di na nwunye erela nwa ọhụru ha n'Abia steeti.
2018-02-20T20:08:55Z
Di na nwunye erela nwa ọhụrụ ha n'ọnụ ego naira 400,000
Nwa ọhụrụ A zọpụtara Chinecherem n'ọnwa Febrụwarị n'ụbọchị iri na asaa. Ngalaba na-ahụ maka nyocha mpụ n'ụlọ ọru ndị uweojii n'Imo steeti a nwuchiela di na nwunye akụkọ kwuru na ha rere nwa ha Chinecherem n'ọnụ ego naira nari puku anọ (400,000),ka ọmụchara nwa ọhụrụ. Dị na nwunye a bụ Ifeanyi, iri ato na ise, na Emmaculata Elijah dị iri atọ bụcha ndị Amakpụ -Umuba, n'Isiala Ngwa North n'okpuru ọchichi dị n'Abia steeti. Mana ha bị na Irete, na Owerri West n'okpuru ọchịchị Imo steeti. Ndị ọzọ a na-enyocha sonyere na mpụ a bụ Grace dị iri ise na ise onye Ụmụọba Ụratta n'okpuru ọchichị Owerri North, Fedalia dị iri ise na ise bụkwa onye Umụoba Ụratta nakwa Amarachi dị iri anọ na itoolu onye sina n'okpuru ọchịchị Ideato North. Onye na-ekwuchitere ndi uweojii ọnụ na Owerri bụ Andrew enwerem kwuru na di na nwunye tụkọtara alo na ntabị anya eji mụcha nwa ha nwaanyị were resi ya obiekwe site n'aka Mezu na Ariri. Enwerem onye kwuputere na di na nwunye a amụọla ụm̀ụ asaa,siri na amaghị ebe ụmụ abụọ n'ime ha nọ. O kwuru na onye isi ndi police n'Imo steeti nyere iwu ka a ma ha ikpe ma enyochasia mpụ a. Enwerem sị na nwa ọhụrụ ahụ enwetaghị ihụnanya na nlekọta nne na nna ka amụchara ya. Di na nwunye kpakọtara nkata ka ha nara Naira 400,000 karia ma i nara nwa ha nwaanyi. Ọ dị ka ihe nkiri mgbe ha nọ na-adọ ndorọndọrọ onye mere mpụ a. Ufọdụ n'ime sị na ọ bụ nne nwa ahụ sonyere na mpu a mana ọ sị na aka ya adịghị ya. Nwaanyị goro nwa ọhuru ahụ gwara ndị nta akukọ na ọ nyere Ifeanyi na Emmaculata ego ahụ na be ha. Ifeanyi kwetere na ya na nwunye ya resiri Obiekwe nwa ha.
[ "Ezinụlọ", "Naijiria", "Ụmụaka", "Mmeru nwata" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43144355
Ipob asaala Gọvanọ Ikpeazu
Ndị otu Ipob asaala Gọvanọ Okezie Ikpeazu gbasara ihe o kwuru maka Nnamdi Kanu.
2018-02-21T16:21:20Z
Ipob egosila iwe ha na-ebe Ikpeazu nọ
IPOB IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti Ndi otu IPOB asaala Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu gbasra ihe o kwuru maka onye isi ha. Site n'akwukwọ ozi ọnu na-ekwuchitere ndi Ipob bụ Emma Powerful detara BBC Igbo, o kwuru na ndi mmadụ ga na-akatọ sị ihe gọvanọ IKpeazu kwuru maka Nnamdi Kanu. O makwara aka si Gọvano Ikpeazu na ndị Ugwu Hausa na-akwado ya depụta ihe niile ga-akwado ihe o kwuru maka onye isi ha,tumaadị na onye isi ha gbahapụrụ Gọvanọ ndi ọwụwa anyanwụ mgbe BBC Igbo service gbara ya ajụju ọnụ. N'ọnụ ya,"gwa ụwa ebe,mgbe ya na ndị ya so zụkọta Nnamdi Kanu. Anyi agaghị ekwe ka ọ gbanahụ asị ọtụru maka onye isi anyi". Ọ sị na ihe ọbula Govanọ Ikpeazu kwuru gbasara onye isi ha emetutaghị ha makana ọ bụ cha asị. Okwu a pụtara na nkwado Ikpeazu na ndị gọvanọ ndị ala Igbo ndị ọzọ kwadoro ndị agha Naịjirịa mgbe ha mere njeghari ha kpọrọ "Egwu Eke" n'ala Igbo na afọ 2017. Ahụgbeghi Nnamdị Kanu kemgbe ndị otu ya si na ndi agha Naịjirịa wakporo be nna ya. Ndị agha Naịjirịa na-agọ na Kanu anọghi ha na-aka. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gịnị ga-akwụsị nsogbu dị n'ịchị ehi n'ala Igbo? 'Akụkọ m ga-akarị nke a' - Simone Biles Ndị uwe ojii ahapụla Ezekwesili
[ "Naijiria", "Nnamdi Kanu", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43135469
Ị ma agụ 'a b ch d' n'asụsụ Igbo?
Lee ndị nwara ịgụ "a b ch d" n'Igbo.
2018-02-22T13:24:02Z
Ị ma agụ 'a b ch d' n'asụsụ Igbo?
Asụsụ Igbo dị ụtọ mana ọtụtụ ndị mmadụ amaghị etu esi agụ mkpụrụ "a b ch d" Igbo nke bụ isi a hụrụ kwawa okpu n'asụsụ Igbo. Anyị kwara ndị mmadụ ka ha gụọ "a b ch d". Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho na Chioma Nkemdilim.
[ "Asụsụ", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43163720
Gọọmenti etiti na-atụ asị-Nwunye Kanu
Lee ihe ndi Uchechi Kano, bụ nwunye Nnamdi Kanu kwuru gbasara di ya, Ipob na gomeenti etiti.
2018-02-22T20:17:03Z
Nwunye Kanu: Gọọmenti etiti na-atụ asị
Uchechi Kanu na Nnamdi Kanu Uchechi Kanu amaghị ebe di ya nọ Nnamdi Kanu bu onyeisi Ipob bụ onye a na-achọ achọ kemgbe September afọ gara aga. Mgbe anyị na nwunye ya bụ Uchechi Kano, na-akpakọrịtara, o kwuru uche ya gbasara ya. Ihe ndị a bụ ihe o kwuru: 1.Ọ maghị ebe di ya nọ O kwuru na ya ahubeghi di ya anya, nakwa n'oge ikpeazu ha ji kpakọrịta bụ mgbe ndị agha bịara gbaa egbe n'ụlọ ha dị n'Umuahia oge ha na-eme "Operation Python Dance". 2.O kwuru na ndị gomeentị etịtị ji di ya O kwuru na ndị gomeenti etiti bụ ndị zitere ndị agha kpọrọ dị ya. N'ihi ya, o kwetere na ha ma ebe ọ nọ. Na ọ bụrụ na ọ dị ndụ na ha bụrụ ya ga Sokoto. Ndị Sinetọ mmadụ 108 nọ na be Ekweremadu E mere ngaghari iwe megide ịchụtu osote Rochas A na-achọ nwata a kemgbe mbido Julaị 3.O maghị ma ọ dị ndụ ka ọ nwuru anwu O kwuru na ndị ji Kanu kwuo ebe ọ nọ. Na ọ bụrụ na ọ nwụọla, ha bupụta ozu ya. 4.O kwuru na ndị gọọmenti etiti na-atụ asị O lotere na mgbe ndị gọọmenti etiti kwuru na ha ejighi di ya, na ha mechara kweta na ọ bụ ha ji ya. Na ndị mere ụdị ihe a, kedu onye ga-ekweta na ihe ha na-ekwu ugbua bụ eziokwu? 5.Lai Mohammed kwuru na ha ejighị di ya Muhammed kwukwara na onyonyo na-egosi mgbe ndị agha gara n'ụlọ Kanu n'Umuahia bụ adịgboroja. Mana Uchechi Kanu ekweteghi na ihe o kwuru. 6.Ọ dị ya ka ndu ya gba ọtọ maka di ya anọghị ya Ọ sị na ọ na-ara ya ahụ ilekọta ụmụ ha sọọsọ ya. Na ọ bụ ihe siri ike. 7.Ọ kasiri di ya obi O kwuru na ihe ga-adị mma. 8.O nweghi uru ọ hụrụ di ya na-erita na njem a ọ nọ na ya O kwuru na otu o si diri ugbua, ha enweghi ụlọ, na onweghi ihe ha nwere. Ihe ndị di ya nwere mgbe ọ nọ ya bụ ihe ndị mmadụ nyere ya. 9.O kwuru na ndị nọ n'ọchịchị agaghị ekwe ka onye Igbo chịa ala Naịjirịa O kwuru na ọ bụrụ na ha ga-ekwe ka ndị Igbo chịa, Ojukwu karị imeri mgbe ọ pụtara ịzọ ọchịchị. O kwukwara na ọ bụrụ na ndị gọọmenti etiti ewepụtaghị di ya, na ndị mmadụ agaghị eme ntụlịaka. 10.O kwuru na o nweghi ncheghari gbasara ihe di ya mere O kwuru na ọ kwụ di ya n'azụ. N'ihe ha na-eme bụ maka ọdịmma na ọganịrụ nke obodo ha bụ Biafra. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ị ma ebe njirimara ala Igbo ụfọdụ dị? 'A ghọrọm nwụnye mmadụ na mkpụrụ ụbọchị isii' Ị ga-ejinwụ asụsụ Igbo gụọ 'National Anthem'
[ "Naijiria", "Abia Steeti", "Nnamdi Kanu", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/43166704
Buhari: Ekpebibeghị m ịzọ ọkwa ọchịchị
Na nzụkọ ya na ndị Gọvanọ APC nwere ụnyaahụ, Buhari sị ha nye ya oge iji nwe mkpebi n'ime onwe ya ma ọ ga-azọ ọchịchị n'afọ 2019.
2018-02-23T08:44:55Z
2019: Buhari ekwuola na ya ekpebibeghị ịzọ ọchịchị
Onyeisiala Naịjiria Muhammadu Buhari Buhari ga-agwa ndị Naịjiria niile ma o kpebie ị zọ ọchịchị Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru nke a na nzụkọ ya na ndị Gọvanọ APC nwere n'abalị ụnyaahụ. Isi okwu nzụkọ ahụ bụ ịkwado Buhari ka ọ ga-niru zọọ ọchịchị na ntuliaka nke afọ 2019 na-abịa. Buhari sara ndị Gọvanọ ahụ si ha nye ya oge zuru oke ka ya nwe ike kpebie n'ime onwe ya tupu o kwuputa ebumnuche ya maka ntuliaka ahụ. Onyeisi ndị otu Gọvanọ ahụ bụ Rochas Okorocha gwara ndị ntaakụkọ na ha kpakọrịtara maka ihe dị ịcheịche metụtara ala Naịjiria ọkachasị ọnọdụ pati ha na ọzụzọ ọchịchị Buhari. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Chụaranụ Naịjirịa aja -Buhari Buhari na ndị isi otu APC enwela mkparịta ụka Ihe iri kọmiti APC kwuru maka nchịgharị gọọmenti Okorocha kwuru na ọ ga-amasị ndị Gọvanọ ahụ ma ọ bụrụ na Buhari zọọ ọchịchị n'ihi na ọ na-eme ọfụma. Nke a bụ ugboro abụọ Buhari na ndị Gọvanọ APC na-enwe nzụkọ n'ime otu izuụka.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Abuja" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43166904
Kee otu bọọlụ ga-akpọtụ n'asọmpị na-abia?
Leicester City, Arsenal na otu bọọlụ di icheiche ga-asọ mpi na ngwụcha izuụka a.
2018-02-23T11:05:46Z
Premier League: Nke a bụ ọgụ ndị dimkpa
kelechi Iheanacho nyere goolu Iheanacho nwa afọ Naịjirịa bụ onye otu Leicester City Asọmpị egwuregwu bọọlụ dị icheiche ga-eme na ngwụcha izu a ga-ekpo ọkụ. N'asọmpị iko Premier League, Leicester City na Stoke City ga-asọ mpi. Newcastle na AFC Bournemouth ga-asọ mpi nke ya. Ndị ọzọ bụ Liverpool na West Ham United, na Watford na Everton. Google ekpụpurula Keshi okpu Oliseh na Fortuna Sittard agbasala Nke a bụ nke mbu Arsenal so na asọmpị UEFA/Europa ke mgbe afọ 2000 N'egwuregwu nke ụnyaahụ, Ostersunds FK meriri Arsenal ọkpụ abụọ a satara otu. Arsene Wenger bụ onye nkuzi Arsenal kwuru na mmeri ha meriri Ostersunds FK n'izuụka gara aga bara ha n'isi. "Anyị amaghị ihe a ga-eji bọọlụ mere, ihe a bụtere anyị nnukwu nsogbu." Newcastle na AFC Bournemouth Newcastle ha ga-emerị na nke a? N'asọmpị nke a na-abịa na ngwụcha izu a, onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ bụ Stehen Mbonu gwara BBC Igbo na asọmpị a nwere ike ị ga ụzọ abụọ. "Bournemouth na Newscastle bụ otu bọọlụ nọ n'ime otu ọnọdụ. Onweghị onye mara onye ga-enwe mmeri." Liverpool na-agbanị ịba ọkwa anọ nke mbu Stehen Mbonu kwukwara n'asọmpị ole na ole gara aga, Liverpool ka na-agba ọfụma. N'asọmpị Liverpool na West Ham United, Stephen nwere olileanya na ndị egwuregwu Mohamed Sala, Sadio Mane ga-eme ọfụma. "Liverpool nwere nsogbu ndị na-agba bọọlụ na etiti na ndị azụ. Otu a kwesịrị ịzụ ndị egwuregwu ọhụrụ n'oge ahịa n'abịa." Akụkọ ndị ga-amasị gị Nwa Didier Drogba esonyela otu Guingamp Champions League: Ka egwuregwu taa nwere
[ "Naijiria", "Premier League", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-43175574
E rila nri elekere atọ tupu ị laba ụra
Ihe ị ga-eme ka ị wee gbochie nri agbarighị agbari nakwa ọkụ obi n'ahụ gị.
2018-02-23T16:47:42Z
Ihe ị ga-eme ka ị wee gbochie nri agbarighị agbari
Nri na-egbochi ọkụ obi na nri agbarighi agbari n'ahụ
[ "Nri", "Ahụike", "Nchọpụta gbasara ọgwụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43187339
Egbuola ndị Boko Haram 5 na Sambisa
Ndị agha Naịjirịa na-ebuso ndị Boko Haram agha egbuola mmadụ 5 n'ime ha ma nwuchikọ otu onye ndi ha.
2018-02-25T06:48:35Z
Ndị agha Naịjirịa egbuola ndị Boko Haram 5 na Sambisa
Ndị agha Naịjirịa Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram Kpọrọ ekwo nkụ Ndi agha Naịjirịa nọ na-ebuso ndị ọmekataraihepụụjọ a na-akpọ Boko Haram agha na ọwụwa anyawụ ugwu Naịjirịa na-akọwa na ha gburu ndị Boko Haram ise na ọhịa Sambisa. Onye bụ osote onye na ekwuchitire ndị agha Naịjirịa na ngalaba nke 'Operation Lafiya Dole' bụ Kọnel Onyeama Nwachukwu kwuru na Maiduguri na ndị agha Naịjirịa nọ ọrụ na Sambisa nwụchịkọrọ otu onyeisi Boko Haram ma tọhapụ mmadụ atọ ha jị eji. Ihe ọzọ ndị agha jidekwara bu ụgbọala na nnukwu egbe na mgbọ ndị Boko Haram jị akpa ike. Ha gbukwara ndị agha Boko Haram ụfọdụ mgbe ha na ekpocha ọdọ Boko Haram ha kpọrọ 'Sabil-Huda' di n'ime ọhịa Sambisa. Konel Nwachukwu kwuru na ndị agha Naịjirịa abụọ merụrụ ahụ ka ha nọ ọrụ a. Nwachukwu sị na ndị agha Naịjirịa bidoro ịbuso ezumezu Boko Haram akpọrọ 'CAMP ZAIRO' agha nke a na Frịde, agbanyeghị na ogbunigwe ndị Boko Haram niri n'ala mebiri ụgbọala ha ji alụ ọgụ ahu. Konel Nwachukwu kwuru na ha nwetere otu ogbaatumtum, igwe abụọ, ọkọrọtọ Boko Haram ato, igbe ise nri oka di n'ime ha, egbe AK47 otu, na ihe ndị ọzọ dị icheiche. Ndị nwe ụmụakwụkwọ Boko Haram nwụchịkọrọ sị na ndi na efu dị mmadụ otu nari na ise. Cheta na Boko Haram na akpa ike na gburugburu ọwụwa anyawụ dị icheiche. Na ịzụụka gara aga, ha wakporo ụlọ akwkwọ dị na Dapchi na Yobe steeti we nwụchịkọrọ ihe ruru ụmụakwụkwọ otu nari na ise.
[ "Boko Haram", "Naijiria", "Ndịagha" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43190136
Mwakpo Dapchi: Ụmụakwụkwọ 110 na-efu
Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi Lai Mohammed, ekwuola na ọ bụ ụmụakwụkwọ 110 na-efu na Dapchi, Yobe steeti.
2018-02-25T19:26:33Z
Lai Mohammed: Ọ bụ Ụmụakwụkwọ 110 na-efu n'obodo Dapchi
Ụmụ akwụkwọ Dapchi Lai Mohammed ekwuola na ọ bụ ụmụagbọghọ 110 na-efu n'ụlọakwụkwọ Government Science and Technical College dị na Dapchi, Yobe State. Ka otu izu na-achọ ịgafe ka ndị Boko Haram wakporo obodo Dapchi dị na Yobe steeti, gọọmentị Naịjirịa ekwuputala na ọ bụ ụmụakwụkwọ 110 ka a tọrọla n'ụbọchị Mọnde ahụ. Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi Lai Mohammed, depụtara akwụkwọ nkwuputa ebe ọ kpọpụtara ọnụọgụgụ mmadụ ole na-efu ka ọ gara Yobe steeti ọzọ taa. O kwuru: "Anyị nọ na Yobe steeti ebe anyị na-agba mbọ imeda obi nne na nna ụmụagbọghọ ndị ahụ, ime ka ha mara na ọbụghị nanị ha kwụ, imekwa ka ha mara na anyị agaghị ezu ike ruo mgbe achọtara ụmụaka ahụ. Anyị ga na-ebu nne na nna ndị a n'ihe niile anyị na-eme gbasara ya." Lee aha ụmụakwụkwọ 105 na-efu na Dapchi' Mwakpo Yobe: Ụmụakwụkwọ abụọ anwụọla Mohammed kwuputara nke a na nzukọ ya na ndị gọọmentị etiti, gọọmentị Yobe, ụlọakwụkwọ ahụ, ndị nne na nna, ndị nchekwa na ndị gọọmentị ọchịchị obodo Bursari ebe Dapchi dị, nwere na Damaturu taa. O kwuru n'onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Adama Abdulkarim na Mohammed Lamin bụ kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Yobe gwara ya na ụmụakwụkwọ 906 nọ n'ụlọakwụkwọ ahụ ụbọchị awakporo ha Nke a na-abịa ka nne na nna ụmụagbọghọ a depụtara aha mmadụ 105 na-efu.
[ "Boko Haram", "Naijiria", "Ntọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa", "Yobe steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43195227
Ipob na-agọ na nkewa dị n'otu ha
Ipob kwuru na onweghị otu Ipob ọhụrụ putara, ha kwukwa na Ezenachukwu Okwudili abụghị onye isi ha.
2018-02-26T12:15:06Z
Enweghị nkewa dị na Ipob - Emma Powerful
Ọkọlọtọ IPOB IPOB bidọ nghaghari iwe ya n'afọ 2012 Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuchitere otu chọ ka ekewapụta Biafra site na Naịjirịa akpọrọ Ipob ekwuola na akụkọ kwuru na Ipob ekewaala bụ akụkọ ashị. N'akwụkwọ ozi Ipob zipuru ndị nta akụkọ, Powerful kwuru na onweghị onye ọbụla bụ Ezenachukwu Okwudili n'akpọ onwe ya onye isi ọhụrụ otu Ipob. O kwukwara n'obụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche bụ kwa ndị iro ala Igbo chọ ka Ipob nwu ọnwụ n'ike. Ipob etieela mkpu ọhụrụ Ipob asaala Gọvanọ Ikpeazu IPOB akpọrịala ndị APC ọdịda anyanwụ "Ihe a chọrọ bụ ka ala Igbo na ndị otu Ipob nwe mgbagwoju anya," Powerful dere. Ugbua BBC Igbo ka na chọ ị nweta ndị kpọrọ onwe ha otụ ohurụ nke Ipob ka ha kwuputa ọnụ nke ha. Ihe anyi mara maka Ezenachukwu Okwudili Ezenachukwu Okwudili bụ aha ọfụụ a na-kpọ maka otu Ipob. Onweghị ọtụtụ ihe amara maka ya Mana ozi Okwudili zịpụrụ ndị ntaakụkọ na-akọwa na Nnamdi Kanu gbahapụola ndị otu ya bụ Ipob Okwudili dere na otu Ipob ọhụrụ nke ya mụpụtara ga-abụ otu na-eme emuma nke ha n'udo Mana ha nyere gọọmentị Naijiria izu-uka abụọ ị tọhapụ ndị otu Ipob niile ajidere na mkpọrọ dị icheiche n'ala Naịjirịa. Nnamdi Kanuna Ipobn'ọnụ ọgụ Ipob bidoro n'afọ 2012, ha na-achọ ka ekewa Naịjirịa wee kenye ha mba nke ha akpọrọ Biafra. N'ọnwa Okotoba 2015, ndị agha Naịjirịa nwụchịrị onye isi ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu na Lagos. Onweghị onye mara ebe Nnamdi Kanu nọrọ ugbua N'ọnwa April nke afọ 2017 ka ụlọikpe ukwu n'Abuja hapụrụ Nnamdị Kanu n'aka Sinetọ Alaribe n'aka mbe. N'ọnwa Septemba afọ 2017 ndị agha bidoro ngagharị ha kpọrọ 'Egwu Eke' wee wakpo be Nnamdi Kanu n'Umuahia. Luo ugbua, onweghị onye mara ebee Nnamdi Kanu nọrọ. N'onwa Septemba afọ 2017, ụlọ ikpe n'Abuja kpebiri n'Ipob bụ otu na-eyi egwu. Ugbua, onweghị ihe gọọmentị kwuru maka otu Ipob a asi pụtara ọhụrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ụgbọelu ịchọ ụmụ Dapchi Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada
[ "Naijiria", "Nnamdi Kanu", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43202514
Gịnị bụ 'window' n'asụsụ Igbo?
BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ ị chọpụta ndị ma asụ Igbo ọfụma.
2018-02-26T14:52:39Z
Kedụ ihe bụ 'window' n'asụsụ Igbo?
BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ ị chọpụta ndị ma asụ Igbo ọfụma. A jụrụ ha ihe bụ "window" n'asụsụ Igbo.
[ "Asụsụ", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43205502
Dapchi: Gọọmenti emeribeghi Boko Haram - Massob
Otu Massob ekwuola mwakpo mere na Dapchi na-egosi na gọọmentị enwebeghị mmeri n'agha ha na-ebuso Boko Haram na Naijiria.
2018-02-26T20:37:12Z
Massob: Dapchi na-egosi na Gọọmenti emeribeghị Boko Haram
Ndị nwe ụmụaka Dapchi na-efu efu Ndị nwe ụmụaka Dapchi na-efu efu nọ na-atụ anya ha Massob akatọọla ọtịtọ atọrọ ụmụakwụkwọ mmadụ otu narị na iri na ụlọ akwụkwọ ha dị na Dapchi, Yobe Steeti. Onye na ekwuchitere Massob ọnụ ha bụ Mazị Bariara Kpalap gwara ndị BBC Igbo na ebe ọ bụ na Boko Haram nwere ike ịtọrọ ụmụakwụkwọ na-eleghị anya na-azụ, o gosiri na gọọmentị akajibeghị Boko Haram nku dị ka ha si wee kwuo. Ọ kwara arịrị na ihe ọdachị dịka nke a nwere ike imekwa ọzọ n'ala anyị, ebe anyị ekutabeghị ume na nke meburu na Chibok, Borno steeti ihe karịrị afọ atọ gara aga. Massob gwara gọọmentị ka ha were ọsọ ọsọ mee ihe nile ha nwere ike ime ka ụmụaka ahụ laghachite n'aka nne na nna ha. O kwuru na ihe ga-eme ndị mmadụ enwekwa ntụkwasị obi ọzọ na ebe goomenti nọ bụ na ha na echekwaba ndụ na akụ na ụba ndị ala anyị ọfụma. Kemgbe ụbọchị ole na ole gara aga, ndị nne na nna ụmụaka ụmụnwanyị ahụ atọrọ nọ n'akwa na iru ụjụ ma na arịọ gọọmenti ka ha kpọghachite ụmụ ha na egbughị oge. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ụgbọelu ịchọ ụmụ Dapchi Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Yobe steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43208185
Champions League: Neymar arọjiela ụkwụ
Neymer agaghị eso n'asọmụnpị Paris St-Germain na Real Madrid makana o merụrụ ahụ.
2018-02-27T08:29:44Z
Ụkwụ Neymar rọjiri akụpụla ya n'asọmpi na-abịa
Neymar da Silva Santos PSG ji nde dọla nari abụọ zụ Neymar n'afọ 2017 Neymar da Silva Santos bụ onye egwuregwu bọọlụ otu Paris St-Germain agaghị eso n'asọmụnpị Paris St-Germain na Real Madrid n'iko Champions League maka omerụrụ ahụ n'ụkwụ. Neymar dị afọ iri abụọ na isii merụrụ ahu n'ogweụkwụ n'ụbọchị ụka n'asọmpị Paris St-Germain na Marseille. NFF echetala Okocha na ndị ọzọ Oliseh na Fortuna Sittard agbasala Ndị dokinta ekwubeghị oge Neymar ga-agbake. Neymar ba otu PSG n'ọnwa August n'afọ 2017, o nyere goolu ruru iri abụọ na itoolu n'ime asọmpị iri atọ. Ugbua PSG ji akara iri anọ karị Monaco. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Joseph Achuzie, Dike Biafra alala Dapchi: Gọọmenti emeribeghị Boko Haram - Massob
[ "Egwuruegwu", "France" ]
https://www.bbc.com/igbo/43237845
Tottenham emeriela Rochadale
Son Heung-min, Fernando Llorente na Kyle Walter-Peters nke Tottenham bụ ndị mmechiri ọnụ Rochadale n'asọmpị ụnyaahụ.
2018-03-01T06:59:27Z
Tottenham na-ele anya iburu iko FA na mmeri Rochadale
Son Heung-min onye Tottenham na ndị otu ya na-nwe anụrị mgbe o nyere goolu n'asọmpị iko FA. Tottenham emerila n'asọmpị iko FA ugboro asatọ N'egwuregwu, ndị otu Tottenham gbara ndị Rochadale ọkpụ goolu isii asatara otu n'asọmpi FA. Mmeri a pụtara na Tottenham na otu Swansea ga-asọ mpi Quarter Final n'iko FA a ga-agba n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị. Son Heung-min nyere goolu nke mbụ na nke ise. Fernando Llorente nyere goolu atọ n'ime nkeji iri na abụọ n'okara nke abụọ, ebe Kyle Walter-Peters nyere goolu nke isi. Son Heung-min kwụsị bọọlụ otu Rochadale Gịnị ga-eme n'ihu? Tottenham ga-aga ọgbọ egwuregwu Wembley n'ụbọchị atọ nke ọnwa Maachị. Ha na Huddersfield ga-asọ mpi n'iko Premier League, tupu ha na Juventus ga-asọmpị nke ha n'iko Champions League n'ụbọchị asaa n'ọnwa Maachị. Otu egwuregwu Rochdale nwere asọmpị 16 ịzọpụta onwe ha tụpụ ha baa relegation na league otu. Asompị ha nke mbụ ga-abụ ha na Plymouth n'ụbọchị atọ n'ọnwa Maachị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Guardiola ebuliela iko ya nke mbụ n'England Champions League: Neymar arọjiela ụkwụ
[ "Naijiria", "Premier League", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/43237576
Onyeisi ndị uweojii enyeela ọnọdụ ịmachị ịchị ehi
Onyeisi ndị uweojii agwala ndị Gọvanọ ka bụrụ ụzọ mepe ebe a na-azụ ehi tupu ha machie ịchịgharị ehi n'steeti ha.
2018-03-01T09:30:31Z
Onyeisi ndị uweojii: Mepe ọdọ ehi tupu ị machie ịchịgharị ha
Ibrahim Idris Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris ekwuola ka steeti bụrụ ụzo wapụta ala ebemaka ọzụzụ ehi tupu ha amachie ịchigharị ehi Onyeisi ndị uweojii kwuru nke a ụnyaahụ na kaduna na nzukọ ndị nchekwa obodo metụtara sịrị na ọ ga-enye aka igbara nsogbu na adapụta n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi. Ọ gara n'ihu kwuo na nsogbu dapụtara na Benue bụ maka na gọọmenti steeti ahụ ehibeghị ọdọ ehi tupu ha machie ịchịgharị ehi Na nzukọ ahụ nke isi okwu ya bụ, "Nkwalite obodo: Nsogbu nchekwa na mkpa ọ dị ịchọta ụzọ zuru oke ịkwụsị ya,"nsogbu dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi ebidoghị n'oge ọchịchị onyeisiala bụ Muhammdu Buhari. Idris kwuru sị:"N'uche m, iji belata ọgbaaghara dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi, gọọmenti steeti ga-agba mbọ wuo ebe ọzụzụ ehi na steeti ha tupu ha eme iwu ikwụsị ịchịgharị ehi. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ngwa ahịa agbaala ọkụ n'Alaba International 'Maka Achuzia, anyị ga-ahụ na Biafra mezuru'
[ "Kaduna", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43238447
E mechiela ụlọụka 700 na Rwanda
E kwuru na ndị mgbasa oziọma niile ga-enweta ọzụzụ mmụta okpukpe tupu ha emepee ụlọụka.
2018-03-01T09:33:17Z
Rwanda: Anyị emechiela ụlọụka 700 maka 'mkpọtụ'
Ndị nọ n'ụlọụka Ndị nọ n'ụlọụka ekpe ekpere Ndị mba Rwanda mechiri ụlọụka ruru narị asaa maka na 'arụsighị ebe ha jiri mere ụlọụka ha ike nakwa na ha na-eme oke mkpọtụ ma ha na-aka ụka'. Ụfọdụ n'ime ha bụ ụka pentikọstal, kama e mechikwara otu ụlọalakụba. Otu onye ọrụ ọchịchị gwara BBC na-emepegharịrị ụfọdụ n'ime ụlọụka 700 ahụ ka ndị nyocha kwadochara ya. E tinyekwara iwu ọhụrụ kwuru na ndị mgbasa oziọma niile ga-enweta ọzụzụ mmụta okpukpe tupu ha emepee ụlọụka. Ụfọdụ ụka pentikọstal nke ndị mgbasa oziọma ha na-arụ 'ọrụ ebube', mụbanyere nke ukwuu na mpaghara Afrịka n'ime afọ ole na ole gara aga. Ebe ụfọdụ ụka nwere ọtụtụ ndị ofufe na-arụ ụlọ dị mma, ụfọdụ ndị nke pere mpe na-arụ ụlọ mkpọmkpọ n'anataghị ikike. Ụfọdụ oge, a na-akpụrụ ụlọụka ndị a n'ọnụ maka iji igwe okwu na-eme ka okwu dapụta ụda achọta ndị ofufe ọhụrụ. Justus Kangwagye bụ onye ọrụ ọchịchị gwara BBC na ihe ha chọrọ bụ ka ụlọụka ndịa mee ihe ndị kwesịrị ekwesị. Kangwagye gwara ndị ntaakụkọ New Times dị na Rwanda n'ụfọdụ ụlọụka ahụ na-etinye ndị otu ha na nsogbu n'ekwesịghị ekwesị. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 'Maka Achuzia, anyị ga-ahụ na Biafra mezuru' Ndị uwe ojii akọwaala iwu mmachị nke Ebonyi
[ "Rwanda", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43227688
Lee ụmụ anụmanụ nọ n'ogige ha n' Imo steeti
Ogige ụmụ anụmanụ dị n'Imo steeti nwere ụmụ anụ ọhịa dị icheiche.
2018-03-02T09:54:06Z
Imo state: N' Imo steeti, ogige ụmụanụmanụ nwere ọtụtụ anụ ọhịa
Ụmụanụmanụ dị icheiche nọ n'ogige ha dị n' Imo steeti. E wukwara ụmụanụmanụ ndị a ụlọ ziri ezi ka ha wee bie ọfụma.
[ "Ọdị ka chikere", "Anụmanụ", "Naijiria", "Ikike dịrị anụmanụ", "Ọdịmma anụmanụ", "West Africa", "Nchekwa ọhịa na anụmanụ", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43257521
A chọtala ụmụakwụkwọ atọro na Dapchi?
Gọọmentị etiti Naijiria ga-ebido chọwa ndị ụmụakwụkwọ 110 atọrọ na Febrụwarị n'obodo ndị agbataobi.
2018-03-02T16:26:16Z
Dapchi: A chọtala ụmụakwụkwọ atọro na Yobe Steeti?
Ndị Agha Naijirịa A tọrọ ụmụakwụkwọ 110 a n'ọnwa Februwarị Taa mere ụbọchị nke iri otu na otu (11) a tọrọ ụmụakwụkwọ na-agụ akwukwọ na Girls Government Girls Science and Technical College (GGSTC) ,Dapchi, Yobe steeti ruru notu nari na iri. Akwụkwọ ozi ndị isi ọchịchị Naijiria depụtara na-ekwu na ha ga-ebido chọwa ha n'obodo ndị agbataobi Naijiria. Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na omenaala nke gọọmenti Naijiria bụ Lai Mohammed depụtara akwụkwọ ozi a. N'ime ya,o kwuru na ndị isi ndị agha akwarala gawa Ugwu Awụsa ka were kwado mbọ ịchọ ụmụ aka ahụ na-efu efu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: E gbuola mmadụ atọ na Rann 'APC na Buhari agbajọọla ndị Naijịrịa' Enugwu steeti ekewapụtala ijeri naira 103 maka 2018 Ndị sonyere na njem a bụ ndị agha Naijiria gbalitere n'ọkwa. Ha gụnyere Gen. Abayomi Olonisakin,Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas; Chief of Army Staff; Lt.-Gen.Tukur,Buratai na Alhaji Lawal Daura. Ha sonyere onyeisi ndị agha ụgbọelụ bụ Air Marshal Sadique Abubakar,onye nke kwagarala Ugwu Hausa. Na mbu, gọọmentị etiti na nke Yobe steeti na-agọ na onweghị ụmụaka na-efu ebe ha kwuru na ha achọtala ha. O bụ mgbe ndị nwe ụmụ aka ndị bidoro tiwe mkpu na-ha ahụ beghị ụmụ ha magbakọ dekọta aha mmadụ nari ise ka gọọmentị kwetara na mmadụ otu narị na iiri na-efu kemgbe ndị Boko Haramwakporo ụlọ akwụkwọ ha n'onwa Februwarị iri na itoolu. E wepụtakwara kọmiti ga-enyocha ihe niile gbasara ntọ ụmụaka ahụ.
[ "Naijiria", "Ntọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43276117
Ndị uweojii anwụchiela ọkaiwu adigboroja
Beatrice Nnamuoh nọ na-arụ ọrụ dịka onye ọkaiwu na Ọrlụ ebe ọ na-enweta mmeri tupu aka kpara ya.
2018-03-04T07:14:36Z
Ndị uweojii anwụchiela ọkaiwu adigboroja
Ndị uweojii Naịjirịa Ọkọrọtọ ndị uweojii Naịjirịa Ndị uweojii n'Imo Steeti anwụchiela otu nwaanyi aha ya bụ Beatrice Nnamuoh ha sịrị na-arụ ọrụ dịka ọkaiwu na-erughieru kamgbe afọ ise. Beatrice gụrụ ihe a na-akpọ 'Sociology' na mahadum mana ọ nọ na-arụ ọrụ dịka ọkaiwu ma na-enweta ọtụtụ mmeri. Nnamuoh, dị afọ 35, bụ onye Iyiawa dị n'Anambra steeti, mana ya na di ya na ụmụ ha anọ bi n'Okporo, nke dị na Ọrlụ n'Imo steeti. Ndị uweojii si na ha nwetere uwe ndị ọkaiwu dị icheiche na akwụkwọ ebiri aha ụlọọrụ ọkaiwu n'ụlọ ebe Nnamuoh bi. Nnamuoh gwara ndị ntaakụkọ Punch gbara ya ajụjụ na ya mere ihe a nke a sịrị na o mere. "Agbanyeghị na m gụrụ Sociology, mụ na ndị ọkaiwu na-arụkọ, ya mere m jiri mụta ihe gbasara iwu. E nwekwara m ụbụrụ. Ya mere, ihe ọ bụla m mere, a na m eme ya nkeọma," Nnamuoh gwara ndị ntaakụkọ. "A hụrụ m ọrụ ọkaiwu na anya. A chọrọ m i nweta ohere gụọ ya na mahadum ugboro anọ, n'ihi ego, emeghi m ya. Ọ bụ maka i nyere onwe m aka mere m jiri tinye aka na nrụrụaka a." Nnamuoh na-arịọ mgbaghara, kwuo na ochegharịala. Mana onyeisi ndị uweojii n'Ime Steeti bụ Chris Ezike kwuru n'aka kpara Nnamuoh n'Orlu mgbe ọghọrọ ndị mmadụ aghụghọ wee napụ ha ego rụrụ naịra 342,000. "Ọ napụrụ ndị mmadụ ego ka ọ tụrụ ha asị ma reesi ha ụgbọala, ebe ọ gwakwara ha na ọ bụ onye ọkaiwu." Ezike kwuru. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị ntọ atọrọla otu onye ntaakụkọ Ipob na-agọ na nkewa dị n'otu ha Ndị mmadụ anwụọla n'ogbaghara na Kaduna
[ "Naijiria", "Mpụ", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43283948
Nwa George Weah ebidola ịsompi na PSG
Timothy Weah agaala PSG ebe nna ya George Weah bụ ezigbo onye egwu ama ọfụma site na 1992 ruo 1995.
2018-03-05T05:48:06Z
Timothy nwa George Weah ebidola ịsompi na PSG
Timothy Weah Timothy Weah ọ ga-emenwu ọfụma ka nna ya dịka ndị mmadụ si eche? Nwa onyeisiala Liberia bụ George Weah a na-akpọ Timothy Weah ebidola ịgba bọọlụ n'otu egwuruegwu PSG, ebe nna ya gbaburu bọọlụ na mbụ. Timothy pụtara n'ọgbọ ụnyahụ ka PSG na Troyes sọọrọ mpi. Ka Neymar na Kylian Mbappe anọghị n'ọgbọ maka ahụ ha merụrụ, Angel di Maria na Christopher Nkunku bụ ndị nyere goolu PSG ji nwete mmeri n'asọmpi a. Neymar na Mbappe n'anọghị ya so nye Weah ohere ịgba n'asọmpi a. George Weah nyere goolu 55 oge ọgbara bọọlụ na PSG Nna Timothy bụ George Weah gbaara ndị PSG bọọlụ tupu n'afọ 23 gara aga, tupu ọ gawa AC Milan. PSG nwere asọmpi 10 n'ihu, n'ime nke ha kwesịrị inweta ọnụọgụgụ 17 ma ọ bụrụ na ha ga-ebuli iko 'French League' nke afọ a. Ha na Real Madrid ga-ezukọ na Tusde ịgba agba Champions League nke abụọ ha. N'agba nke mbụ, Real Madrid ji 3-1 merie ha. Onye egwu ha bụ Neymar agaghị asọmpi ọzọ n'ime 'season' a maka ahụ ọ merụrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ụgbọelu ịchọ ụmụ Dapchi Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada Egwu ndị Fulani na-achị ehi ejidela ọtụtụ
[ "Egwuruegwu", "France" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43283950
Ọgụ Fulani na Mambila amalitela ọzọ
Mmadụ ruru 40 anwụọla na mwakpo mere na Mambila plateau ka ndị Fulani na ndị Mambila bara onwe ha ọgụ.
2018-03-05T07:18:38Z
Egbuola ọtụtụ mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọku na Taraba
Ndị uweojii Naịjirịa Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue na Taraba maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi Nsogbu amalitela ọzọ na gburugburu Mambila plateau dị na Taraba Steeti nke mere ka ndị mmadụ na-atụ ụjọ na-egbuola ọtụtụ mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ n'obodo Yelwa na Mesamari dị na Sardauna Local Government na Steeti a. N'agbanyeghị na ndị hụrụ ihe mere na-akọwa na-egburu ihe karịrị mmadụ 40 na mwakpo a ha sị bidoro n'abalị Satude, ndị uweojii na Steeti ahụ gwara BBC na ha amaghị mmadụ ole ihe metụtara. Egwu ndị Fulani na-achị ehi ejidela ọtụtụ Obaseki amachiela ichi ehi n'abali Ganduje nwere ala ga abata ndị na-achị ehi Ndị uweojii kwuburu na mmadụ ise nwụrụ na mwakpo nke e mere na Tụsde mgbe ndị Fulani na ndị Mambila nwere esemokwu. Mana mwakpo a mekwara n'abalị Satụde ma ruo Sọnde, butere ogbugbu ọtụtụ mmadụ. Ndị uweojii na-akọwa na ebe ihe a mere jụzịrị oyi ka ha zipụrụ ndị uweojii gburuguru ebe ihe a na-eme. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ụgbọelu ịchọ ụmụ Dapchi Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada Egwu ndị Fulani na-achị ehi ejidela ọtụtụ
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Ọgụ ndị na-achịehi", "Taraba steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43276401
Charly Boy: Ndị ọjọọ na-achị Naịjirịa
Charles Oputa bụ onye ejiri 'Charly Boy' mara kwuputara iwe ya gbasara usoro ọchịchị Gọọmenti Naịjirịa.
2018-03-05T08:33:23Z
Charly Boy ekwuola na ọ chọrọ ndị ntoroọbịa pụrụiche maka ịchị Naịjiria
Onye ama ama dịka Eze ndị ntoroọbịa na Naịjirịa bụ Charly Boy kwuru na obi adịghị ya mma maka ọnọdụ Naịjirịa. Mgbe ndị BBC Igbo gbara ya ajụjụọnụ, ọ jụrụ "Gịnị mere o jiri bụrụ ndị ọjọọ na-achị Naịjirịa?". Charly Boy kwuru na ọ na-achọ ndị ntoroọbịa pụrụiche ọ ga-akwado maka ị were oche ọchịchị Naịjirịa. "Ọbi na-agwa m kamgbe afọ iri atọ na ise gara aga na nzọpụta Naịjirịa ga-abụ maka ndị ntoroọbịa pụrụiche," dịka Charly Boy kwuru.
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43284820
Oscars 2018: Ka ọ si gaa
Onye ọgba basket bọọlụ Amerịka bụ Kobe Bryant e soro la na ndị ritelu ugo na ntuliugo nke ihe onyonyo a.
2018-03-05T10:07:22Z
Oscars 2018: Kobe Bryant so na ndị nwere nrite
Kobe Bryant onye egwuregwu bọọlụ Amerika ama ama Mmeri pụrụiche - Kobe Bryant emeriela N'ihe ịtụ anya mere ka Kobe Bryant bụ onye ama ama ka ọgbaa basketbọọlụ n'Amerịka atụrụla ugo na ntuliugo nke ihe onyonyo a na-akpọ Oscars. O ritere ihe a maka ihe onyonyo nke eserese nwa-oge. Lee ndị ọzọ nwere nrite na Oscars emere n'ọnụ utụtụ a. Ndị mmeri: The Shape of Water nwere nrite nke 'Best picture' Frances McDormand ritere nke a na-akpọ 'Best actress' maka Three Billboards Outside Ebbing, Missouri Onye ritere nke a na-akpọ 'Best actor' bụ Gary Oldman maka Darkest Hour Guillermo Del Toro ritere nke a na-akpọ 'Best director' maka The Shape of Water Get Out nke Jordan Peele dere ritere 'Best original screenplay'
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Ihe nkiri", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43285489
Oscars 2018: Ihe ndị nkiri yi gaa
Abalị ihe nrite akacha ekwu maka ya na Hollywood emela. Lekwa foto ihe ndị mmadụ yi pụta na 'red carpet'.
2018-03-05T10:19:07Z
Oscars 2018: Ihe ndị nkiri yi pụta n'ọgbọ
Danai Gurira mere ihe nkiri Black Panther na Walking Dead gosiri ihe esere n'akụkụ isi ya Ihe nrite Academy Awards nke ama ama dịka Oscars nke ugboro 90 mere n'abalị ebe ndị mmadụ gosiri ekike ha. Lekwa ihe ndị na-eme ihe nkiri yi bịa emume a. Daniel Kaluuya Daniel Kaluuya bụ onye Britain so mee ihe nkiri Get Out so na ndị akpọrọ aha inweta ihe nrite Oscar Lupita Nyong'o Lupita Nyong'o nwetara Oscar n'afọ 2012 maka ihe nkiri o mere nke akpọrọ 12 Years a Slave Jennifer Lawrence Uwe Jennifer Lawrence bụ onye mere ihe nkiri Hunger Games yiri akpụrụakpụ Oscar n'acha ọlaọcha Andra Day Andra Day bụ onye Amerịka na-agụ ma dee egwu, dina ala na red carpet, sị ndị mmadụ bịa lere uwe ya Oscars 2018: Ka ọ si gaa Black Panther na-ewu ọfụma E gosiri Afrịka n'emume mbido 'Black Panther' Black Panther: Kedụ ụma ị bụ na ihe nkiri a? Tom Holland Tom Holland mere ihe nkiri Spider Man yi ezigbote uwe bịa kpọpụta aha onye nwetara ihe nrite n'emume a Chadwick Boseman Chadwick Boseman bụ eze T'challa nke obodo Wakanda n'ihe nkiri Black Panther yi uwe Givenchy kwara bịa Oscars Ashley Judd Ashley Judd nke tinyere ọnụ n'ime okwu Time's Up yi uwe na-acha odoodo pụta na red carpet Adam Rippon Adam Rippon n'eme egwuregwu olimpiks bekee kpọrọ figure skating mere ka ndị mmadụ kpụrụ ya n'ọnụ ka o yi uwe nwere ihe eji eke ajị mere ka ọ dị ka o si n'ime ihe nkiri Fifty Shades Of Grey rịpụta Salma Hayek Salma Hayek yi uwe na-acha odoodo pụta Darrell Britt-Gibson Ndị ose foto serela na-aga ka Darrell Britt-Gibson mere ihe nkiri Three Billboards maliri elu na red carpet Whoopi Goldberg Uwe Whoopi Goldberg yi n'ahụ dị ka dragon esere n'ahụ ya Patrick Stewart Sir Patrick Stewart mere ihe nkiri X-Men yi ntụtụ edere Time's Up n'uwe ya ka onyere ndị ose foto nsusu Sally Hawkins Sally Hawkins, onye Britain so na ndị akpọrọ aha inweta ihe nrite maka ihe nkiri The Shape of Water o mere chịsaara ndị ose foto ọchị Saoirse Ronan Saoirse Ronan mere ihe nkiri Lady Bird yi uwe pink pụta na red carpet Oscars ka afọ 10 gachara oge mpụta mbụ ya n'afọ 2008 oge ọ ka bụ nwata dị afọ 13 Meryl Streep Akpọọla Meryl Streep aha maka inweta ihe nrite Oscars ugboro 21 kamgbe o bidoro ime ihe nkiri Margot Robbie Margot Robbie mere ihe nkiri I, Tonya mara mma n'ihe o yi pụta na red carpet Tiffany Haddish Tiffany Haddish kere ezigbote ekike ndị Afrịka nke eji mara ụmụnwaanyị Eritrea na Ethiopia Foto niile a nwere ihe bekee na-akpọ copyright.
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Ihe nkiri", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43285490
Oscars 2018: N'etiti Afrịka na Naịjirịa
Abịa n'ihe nturugo kachasị ada ụda n'ụwa ihe nkiri akpọrọ Oscars, ndị mpaghara Afrịka na-egosi Naịjirịa nkarị.
2018-03-05T15:42:40Z
Ihe mba Afrịka ndị ọzọ ji kara Naịjirịa mma n'ihe nkiri
Akpụrụakpụ ihe nrite Oscars 2018 a mere ya afọ 90 a na-eme nturugo Oscars na Hollywood Ka emechara Oscars nke bụ emume nturugo kachasị ada ụda n'ụwa ihe nkiri nke 2018, BBC Igbo nyochara ma hụ na mba Afrịka ndị ọzọ ka Naịjirịa mma n'ihe gbasara ihe nkiri. Oscars 2018: N'etiti Afrịka na Naịjirịa BBC chọpụtara na n'agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-emepụta ihe nkiri na Naịjirịa na-etinye ụfọdụ ndị Hollywood n'ihe nkiri ha, o mebeghị ka ha soro na ndị a na-akpọ aha inweta nturugo ọbụla na Hollywood. Nollywood bụ ndị na-emepụta ihe nkiri na Naịjirịa na mpaghara Afrịka ndị ọzọ so na ndị a na-anụ aha ya, ndị mba Afrịka ndị ọzọ egosila ha nkarị. • Lupita Nyong'o bụ nwaafọ Kenya bi n'Amerịka nwetara ihe nrite 'nwaanyị kacha akwado ihe nkiri' n'afọ 2013 N'afọ ole na ole gara aga, a na-ahụbụ Naịjirịa dịka 'dike' n'ihe nkiri n'Afrịka, mana ugbua, ọ dị ka ndị ọzọ agaferela ha. Ebe Nollywood n'onwe ha bụ ndị nọ n'ọkwa abụọ n'ụwa ihe nkiri na-emepụta ihe nkiri karịrị 1000 n'ime otu afọ, Hollywood na-emepụta ihe na-erughị nke ahụ mana ọkwụsịghị ha ịbụ ndị ụwa niile na-ele anya na ha kacha emepụta ihe nkiri kacha mma. Mana abịa n'ime Afrịka, mba Kenya na Saụt Afrịka na-egosi Naịjirịa nkarị ebe ọ gbasara ihe nrite sitere na nturugo Oscars. N'isi n'isi Saụt Afrịka Nanị Saụt Afrịka nweterela ihe rite maka 'ihe nkiri kacha mma ndị mba ofesi mere' akpọrọ Tsotsi Ha nwetara ihe nrite a n'afọ 2005 Nanị Saụt Afrịka bụ mba Afrịka nwere ndị a kpọrọla aha inweta ihe nkiri (nominate) ugboro itoolu Charlize Theron bụ nwaafọ Saụt Afrịka bi n'Amerịka nwetara ihe nrite 'nwaanyị kacha eme ihe nkiri' n'afọ 2004 maka ihe o mere n'ihe nkiri akpọrọ Monster Kenya Lupita Nyong'o bụ nwaafọ Kenya bi n'Amerịka nwetara ihe nrite 'nwaanyị kacha akwado ihe nkiri' n'afọ 2013 maka ihe o mere n'ihe nkiri a kpọrọ '12 Years a Slave' Mark Peploe bụ onye Kenya nwetara 'Academy Award for Writing Adapted Screenplay' n'olu bekee maka ihe nkiri a kpọrọ, 'The Last Emperor'. Naịjirịa Chiwetel Ejiofor bụ nwaafọ Naịjirịa a mụrụ na Britain so na ndị a kpọrọ aha inweta ihe nrite 'nwoke kacha eme ihe nkiri' n'afọ 2014 maka ihe o mere n'ihe nkiri '12 Years a Slave' Sophia Okonedo bụ nwaafọ Naịjirịa a mụrụ na Britain so na ndị a kpọrọ aha inweta ihe nrite 'nwaanyị kacha akwado ihe nkiri' n'afọ 2005 maka ihe o mere n'ihe nkiri 'Hotel Rwanda.'
[ "Ihe nkiri", "Naijiria", "Kenya", "West Africa", "South Africa", "Ọwụwa anyanwụ Afịrịka", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43287449
'Achọrọ m ịtọpụ Enugwu n'agbụ' - Kenneth Okonkwo
Onye na-eme ihe nkiri bụ Kenneth Okonkwo egosipụtala mmasị ya ịzọ gọvanọ Enugwu steeti n'afọ 2019.
2018-03-05T18:50:29Z
Kenneth Okonkwo: Enugwu steeti nọ n'agbụ ugbua
Kenneth Okonkwo Kenneth Okonkwo na-azọ gọvanọ Enugwu n'okpuru pati APC Onye na-eme ihe nkiri bụ Kenneth Okonkwo nke e ji "Andy Okeke" mara ekpebiela na ya ga-azọ ọchịchị ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti n'afọ 2019. Kenneth bụ onye Nsukka dị n'Enugwu gwara BBC Igbo na ọ bụ mmasị ya ime ka Enugwu steeti ga n'iru dịka ọrụ nkiri ha bidoro na Naịjirịa si gaa n'iru. Kenneth so na ndị mere ka ọrụ nkiri Naịjirịa bụrụ ihe na-ewuewu na mba ụwa dịka o sonyere na ihe nkiri e mere n'asụsụ Igbo a kpọrọ, "Living in Bondage". Kenneth Okonkwo kọwara BBC Igbo na ihe nkiri ọ na-eme bidoro ka ihe egwuregwu na ihe iji nwe aṅụrị na abụghị akaọrụ mana ọ gara nke ọma bụrụ ihe mepụtara ihu Naịjirịa. O kwuru na dịka ya siri ga n'ihu n'ọrụ nkiri ka ya siri chọọ ime ka Enugwu steeti gaa n'ihu. Kenneth katọrọ ọchịchị Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi bụ aka na-achị Enugwu steeti kwuo na ndị Nsukka anaghị enwe aṅụrị n'ọchịchị ahụ. Ọ gwara BBC Igbo na nanị afọ anọ ka ya chọrọ ịchị. Ọ na-azọ ọchịchị n'okpuru pati ndị APC. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Oscars 2018: N'etiti Afrịka na Naịjirịa Anwụchiela onye ohi akara ATM Onyeisiala Buhari ga-aga Taraba Steeti Ihe ndị ị na-amaghị maka Kenneth Okonkwo 1. Ọ bụ onye Nsukka dị n'Enugwu steeti. 2. O mere agwa Andy Okeke n'ihe nkiri a na-akpọ "Living in Bondage" nke e mepụtara n'afọ 1992. 3. Ọ bụ onye ọkaiwu, ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum UNN nakwa UNILAG. 4. Ọ lụrụ nwa ụkọchukwu ya n'afọ 2000 mana ha gbara onwe ha alụkwaghị m n'afọ 2002. 5. Ọ mụrụ ọkpara ya n'afọ 2016 ka ọ gasịrị afọ itoolu ọ lụrụ nwunye ya nke abụọ bụ Ifeoma Okonkwo. Kenneth esonyela ndị na-eme onyonyo bara ndọrọndọrọ ọchịchị Kenneth nwere nkwado aka chịburu Enugwu bụ Sullivan Chime Ndị na-eme ihe nkiri na Nollywood dịka Desmond Elliot, Kate Henshaw na ọtụtụ ndị ọzọ esirila na ihu TV banye ọrụ gọọmenti na steeti ha dị icheiche. Kenneth Okonkwo gwara BBC Igbo na ya nwere ntụkwasị obi na ndị Enugwu ga-akwado ya dịka aka chịburu Enugwu Sullivan Chime kwadoro ya. N'aka nke ọzọ, onyeisi pati APC n'Enugwu steeti bụ Ben Nwoye kwuru na Kenneth pụrụ imeri ntuliaka n'afọ 2019. Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nọ pati PDP dịka ọchịchị ya ugbua bụ nke mbụ.
[ "Nollywood", "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria", "Enugu Steeti", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43307729
Serena Williams chọrọ ibido asompi ụmụnwaanyị
Onye a ma ama na mba ụwa n'egwuregwu tenis bụ Serena Williams ekwuputala na ọ chọrọ imalite asọmpi tenis ụmụnwaanyị.
2018-03-07T04:42:29Z
Serena Williams chọrọ ibido asompi ụmụnwaanyị n'Afịrịka
Serena Williams Williams kwụsịrị ịsọmpi n'ọnwa isii gara aga ịga mụọ nwa Serena Williams, bụ onye mba ụwa ma ama n'egwuregwu tenis, ewepụtala atụmatụ na mkpali o nwere ibido asọmpị mba ụwa n'egwuregwu tenis maka ụmụnwaanyị n'Afịrịka. Ọ bụrụ na ọ gaa nkeọma, nke a ga-abụ bụ na mpaghara Afịrịka. Ọ gwara BBC Sports na ọ bụ ihe dị ya n'uche. N'okwu ya; "Ọ bụ ihe dị m n'obi, echekwala m ya ma a ga m aga n'ihu na-echkwa ya. Ọ na enye m obi aṅụrị maka na a na m eche na ọ ga-abụ ezi ihe ga-atọkwa ụtọ nke ukwu ebe ndị egwuregwu ga-esi na ya pụta site na mpaghara Afịrịka ga-adị nnukwu". Akụkọ ndị ga-amasị gị: Wenger: Ndị egwuregwu England dị aghụghọ Kee otu bọọlụ ga-akpọtụ n'asọmpị na-abia? Ahụ esichaghị Aubameyang ike Asọmpi ahụ a na-akpọ WTA n'aha ịchafụ bụ nke ndị ọkacha mara n'egwuregwu tenis na-eme, ndị na-ekpokoba ya bụ otu Women's Tennis Association (WTA). Williams kwuru na ya ga-achọ ka asọmpi ahụ mee na mba Kenya dịka o kwuru na Kenya bụ otu ebe na-amasị ya ịga nke ukwu. O kwuru na ya ga-akwado ịlaghachi ngagharị WTA n'ọnwa isii gafee ka ya mụsịrị nwa. Williams a tụrụla ugo tenis a kpọrọ Grand Slam Singles ugbo 23.
[ "Kenya", "Afịrịka", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43313105
A ga-elikọta ndị nwụrụ na mwakpo Benue
Gọvanọ Ortom nke Benue sị na ha ga-elikọta ndi nwụrụ na mwakpo Omusu nke mere na Mọnde.
2018-03-07T07:14:29Z
A ga-elikọta ndị nwụrụ na mwakpo Benue steeti
Nwaanyị na-ebe akwa ebe a na-eli mmadụ Eliri mmadụ 73 nwụrụ na mwakpo emere na Benue n'ọnwa Jenụwarị Gọọmenti Benue Steeti ekwuola na ha ga-elikọta ndị nwụrụ na mwakpo ndị a na-eche na ha bụ ọchịehi wakporo obodo Omusu, nke dị n'Edumoga dị na gọọmentị obodo Okpokwu nke Steeti ahụ na mgbede Mọnde. Ihe a na-eme ka Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwere nkwa ịga steeti ahụ na ebe ndị ọzọ ọgbaghara a na-ebo ndị Fulani na-achị ehi dị na Naịjirịa. Nke a bụ otu n'ime ọtụtụ ogbugbu mmadụ na-eme na Benue Steeti. Ogbunigwe 'egbuola mmadụ 3 na Maiduguri' Ọgụ Fulani na Mambila amalitela ọzọ Na mbido afọ a, mwakpo emere na gọọmentị obodo abụọ gburu mmadụ 73 ma bute mmebi ụlọ na akụnaụba. Igbu mmadụ bụzị ihe na-eme mgbe niile na Benue kamgbe ahụ. Mwakpo nke Mọnde merụkwara ọtụtụ mmadụ ahụ ma mee ka a na-achọ ụfọdụ ma ruo ugbua. Ndị mere mwakpo a gbakwara ụlọ, ọba nri na akụnaụba ndị ọzọ ọku. Otu onye hụrụ mgbe mwakpo a mere na-akọwa na ọ bụ n'elekere anọ nke mgbede ka ndị omekome a wakporo obodo ma bido ịgba ihe ọbụla ha hụrụ egbe. Gọvanọ na-achị Benue Steeti bụ Samuel Ortom so na ndị mbụ gara mgbaru n'obodo ihe a metụtara. Gọvanọ Ortom duuru ndị ọchịchị ya ịga hụ ihe mere. Ọ gwara ndị Omusu na ndị a na-akpa ike si mba ofesi bata, ma kwukwa na-agaghị anabata ogbugbu mmadụ a ndị ọchi ehi na-eme. O kwukwara na ọ bụ mmadụ 24 ka ha ma nwụrụ n'otu ụbọchị na mwakpo a. Ortom sị ka ndị nchekwa nwụchie ndị isi Miyetti Allah, bụ ndị o na-ebo ebubo na aka ha dị n'ihe na-eme na Benue. Ọ gakwara n'ihu kwuo na a ga-elikọta ndi nwụrụ na mwakpo a. Olofu Ogwuche, bụ onye na-achị gọọmenti obodo ebe ihe mere, sị na ọgbaghara a bidoro mgbe ndị ọchịehi bịara gwa ya na ehi ha na-efu. Ọ sị na ọ bụ ka ọ na-enyocha ihe mere ka awakporo obodo ahụ. Nsogbu ndị ọchiehi na ndị na-akọ ugbo so n'ezigbote nsogbu Naịjirịa nwere ugbua. Onyesiala Buhari ezipụla ndị agha na ndị uweojii ka ha gaa ọrụ nchekwa n'ebe ihe a kachasị eme. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ghana na-eme mmemme nnwereonwe ha taa Otu AU enwetala onyeisi ọhụrụ bụ Paul Kagame Otu #OurMumuDonDo chọrọ ime ngosiiwe
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Benue steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43322983
'A na-emegbu Ndigbo ka ndị emeriri n'agha'
Otu onye zọburu ọkwa Gọvanọ na Anambra Steeti bụ Chike Obidigbo ekwuola na gọọmenti Naijiria ugbua na-akpaso Ndigbo agwa dika ndị emeriri n'agha.
2018-03-08T04:38:23Z
Obidigbo: A na-emegbu Ndigbo ka ndị emeriri n'agha
Dọkita Chike Obidigbo Dọkita Chike Obidigbo Chike Obidigbo kwara arịrị na kemgbe ọchịchị nọ ugbua batara, onweghị ọkwa nwere isi onye Igbo ji na Abuja. O kwuru na onye ọbụla na-asị ka Naijiria bụrụ otu kwesiri ibu ụzọ mee ka Ndigbo nweta oke ruru ha dịka ndị Awụsa na ndị Yoruba. Obidigbo kwuru na ekwesịrị ịghagharị usoro ochịchị n'Naijiria ka ọghara inwe agbụrụ a na-emegbu emegbu. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ihe na-agba anya mmịrị na nanị ọdịda anyanwu bụ Igbo bụ ebe e nwere steeti ise, ebe ndị ọzọ ka n' ọnụọgụgụ. Nke a mere na-abia n'ụlọ omebeiwu Ndigbo enweghị ọtụtụ ndị na-ekwuru ha ọnụ ha nke ha na- enwe ndị ga-enwetara ha oke ha ma atụliba aka n'ụlọ omebeiwu abụọ dị na Naijiria. Obidigbo kwuru na ọ bụrụ na goomenti chọrọ ime ka obodo a dị mma, ha ga-eme Okeke ka ha mere Okafọ. O nyere ọmụmaatụ site na ihe mere na Kano steeti, ebe INEC hapụrụ ụmụaka ha soro mee ntụlịaka. Obidigbo nyere Goomenti ndụmọdụ ka yabụ ọgụ ha na-anụso mpụ na aghụghọ bụrụ eziokwu site na inyocha ụlọọrụ INEC na etu ha si arụ ọrụ ha.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43334870
Gọọmenti Britain ga-arụ ụlọ mkpọrọ na Naijiria
Gọọmenti Britain amapụtala ego dị otu nde dolla ịjị rụọ ụlọ mkpọrọ na Naịjiria.
2018-03-08T17:35:13Z
Britain ga-arụ ụlọ mkpọrọ na Naijiria
Gọọmenti Britain adịla njikere ịrụ ụlọ nkpọrọ na'Naijiria Onye ode akwụkwọ ndị Britain na ihe na-eme na mbaọzọ bụ Boris Johnson kwuru na ya bụ ụlọ mkpọro ọhụrụ ga-enyere aka imejuputa mkwekorita Nijiria na Britain nwere ịdị na-agbanwe ndị nga ejidere . Mgbanwe a ga-eme ka nwa afọ ọbụla ejidere dara iwu na-ala ọzọ ka akpọlaa ya obodo ya ka ọga nọọ afọ ole atụrụ ya n'ụlọ mkpọro. Ụlọ mkpọrọ ahụ a na-ekwu na oga adi ọnụ ụlọ otu nari na iri na abụọ, bụ nke aga eguzobe n'ime ụlọ mkpọro kirikiri dị na Lagos steeti wee dowe ndi nga ụmụ Naijiria karịrị nari atọ nọ na Britain. Nke a so na nkwekọrịta Naijiria na Britain nwere na 2014 na onye ọbụla atụrụ nga na Britain ga-ala na be ha gaa mkpọrọ. Dịka ndị ụlọ ọrụ na-ahụ maka ikpe na Britain siri kwuo, ụmụ nijiria nọgasi n'ụlọ mkpọro di iche iche na Britain di nari ato na iri na abụọ n'ọnụ ọgụ ka mgbe 2016. Onụ ọgụ a na-egosiputa pasenti atọ na agbakọọ ndi nile nọ n'ụlọ mkpọrọ na abughi ala nna ha n'uwa nile. Mana ndị na-ahụ maka ikike diara mmadụ kwuru na ọnọdụ ụlọ mkpọrọ na Naijiria bụ ihe ịgba anya mmiri. Ha kwuru na ọnọdụ ahụ jọrọ njọ nke ukwuu nke na ndị ala anyị nọ n'ụlọ mkpọrọ anaghị ekwe alọta . Ndi emekwaranụ mmanye, na-aga gbaa akwụkwọ sị na ọnọdụ ụlọ mkpọro Naijiria na-emegide ikike diara mmadụ nke ha. Ya mere gọọmenti Britain jiri werezia aka ya malite njem irụ ụlọ mkpọro ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: 'A na-emegbu Ndigbo ka ndị emeriri n'agha' Osu a ga-akwụsị n'ala Igbo? Lee nnukwu ihe Kathleen Thomas mere
[ "United Kingdom", "Naijiria", "Nga" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43336462
'Nyenụ ụmụnwaanyị ọkwa dị elu n'ọrụ ụlọakụ'
Gọvanọ ụlọakụ ukwu bụ Godwin Emefiele akpọọla oku ka e soro na-enye ụmụnwaanyị ọkwa ndị elu n'ọrụ ụlọakụ.
2018-03-08T18:27:25Z
Emefiele: Nye ụmụnwaanyị ọkwa dị elu n'ọrụ ụlọakụ
Godwin Emefiele Godwin Emefiele bụ Govanọ ụlọakụ ukwu Naijiria Emefiele kpọrọ oku a taa n'Abuja mgbe ọ na-ekwu okwu na mmemme iji cheta ụbọchị ụmụnwaanyị n'ọkwa dị elu n'ọrụ ụlọakụ. O kwuru na ọnọdụ e nwere ụgbua ebe ọ bụ sọọsọ mmadụ atọ n'ime mmadụ iri abụọ na asaa bụ ndị isi ụlọ akụ na Najiria adịghị mma. O kwuru na CBN enyewanyela ụmụnwaanyị ohere ịnọ na nnụkwụ ọkwa gbagoro sitere na otu nwaanyi ibụ diretọ n'afọ 2001 gbalie ga ụmụnwaanyị isii n'afọ 2017 ebe pacent ụmụnwanyi CBN were n'ọrụ gbaro site na pacent iri abụọ na anọ ga iri abụọ abụọ na asatọ. O kwuru na CBN mara mkpa ụmụnwaanyị dị n' ịnọ na nnukwu ọkwa nke mere ka ha nwe atụmatụ iji kwalite ha. "Dika a matara na ụmụnwoke kachasị nọrọ na nnukwu ọkwa n'ọrụ ụlọakụ, the kọmịti na-ahụ maka ọrụ ụlọakụ nke a kpọrọ bankers' Committee n'aha bekee, ewpụtala quota ga-enye ụmụnwaanyị pacent iri atọ." Emefiele kwuru na ọ dịkwa mkpa ka ụmụnwaanyị na-esonye n'ihe a na-eme ọnọdụ dị mkpa na ọrụ na-abụghị nke gọọmenti. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmenti Britain ga-arụ ụlọ mkpọrọ na Naijiria 'Busonu omenaala na-emegbu ụmụnwaanyị agha' Ndị dọkịta Naịjirịa enwere ike ịjụ mbuli ụgwọ?
[ "Naijiria", "Ikike ụmụnwanyị", "Akụ na ụba", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43337251
Hapụrụ anyị ụmụ anyị - Aisha Buhari
Nwunye onyeisiala Naịjịrịa bụ Aisha Buhari a gwala ndị na-awakpo ma tọrọ ụmụaka ụmụnwaanyị ka ha hapụ ha.
2018-03-09T04:47:39Z
Aisha Buhari: Ndị Boko Haram hapụrụnụ anyị ụmụ anyị
Aisha Buhari Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Nwunye onyeisiala Naịjịrịa bụ Aisha Buhari etiela mkpu ka ndị Boko Haram na ndị omekome ndị ọzọ na-eyi ọha egwu kwụsị ịtọrọ ụmụaka ụmụnwaanyị. Nke a bụ iji tinye olu ya n'okwu mba ụwa dịka e mere mmemme ncheta ụmụnwaanyị ụnyaahị. N'okwu ya, Aisha kwuru na Maachị 8 dị iche na mmemme ndị ọzọ maka ụmụaka Dapchi na Chibok ndị kwesiri ị nọ na be ha. Ọ malitere okwu nke ọ kpọrọ "Hapụru anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị" nke o kwuru na ọ bụ oku ọ na-akpọ iji kwụsị ntọrị, ebe ọ rịọrọ ndị mgbasaozi ka ha gbasara ya ozi a. Ọ gwakwara ndị nwunye gọvano ka ha sonyekwa na mgbasaozi ahụ na steeti ha dị icheiche ka ọ na-akpọtu n'akụkụ Naịjirịa niile. Ọ sịrị: "Hapụrụ anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị. Hapụrụ anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị. Hapụrụ anyị ụmụ anyị ụmụnwaanyị" ka o kwuru. O depụtakwara ya n'ozi ya n'igwe Facebook. Na mbido, nwunye osote onyeisiala Naịjiria bụ Dolapo Osibanjo kelere ụmụnwaanyị na mmemme nke ụbọchị ụmụnwaanyị mana o kwuru na ụmụnwaanyị Naịjirịa nọ n'ọnọdụ dị njọ n'oge a. Ihe ndị ọzọ ụmụ Naịjirịa na-ekwu gbasara ụmụnwaanyị Ụmụ Naịjirịa na Twitter na-ekwupụta uche ha gbasara mmemme ncheta ụmụnwaanyị : Ola Ola kwuru na ụmụnwaanyị na-akwado onwe ha na-akwụkwa onwe ha n'azụ. Saamira Sanusi kwuru na ya na-ebu n'uche na o nwere nwata nwaanyị na-ele ya anya oge ọbụla ya na-eme ihe ọbụla. Stella Udobong kwuru mkpa ọ dị ka a zụgharịa ụmụaka ma kuziere ha mkpa ndụ dị ka a ghara iji ụmụnwaanyị mere ndị na-ebu ogbunigwe dịka ndị Boko Haram na-eme. Ụfọdụ chetakwara dọkịta Stella Ameyo Adadevoh bụ onye tufuru ndụ ya iji zọọ ndị ọzọ ndụ oge ọrịa Ebola wakporo Naịjirịa n'afọ 2014 nakwa onye bụbụrụ Mịnịsta ọrụ mgbasa ozi na Naịjirịa nke nwụrụ anwụ bụ Dọra Akunyili. N'aka nke ọzọ, onye odeakwụkwọ mba ụwa a ma ama bụ CHimamada Ngozi Adichie akpọọla oku ka mmadụ niile tinye uchu na ịkwado ụmụnwaanyị. Chimamanda kwuru nke a oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka, lee ya n'onyonyo a: Chimamanda tinyere olu ya n'egwu oti egwu mba ụwa bụ Beyonce. Akụkọ ọzọ ga-amasị: 'Ụmụnwaanyị anyị kajara akaja' - Charly Boy Naịjiria enwere ndị nkuzi ha ga-ebinye Liberia?
[ "Chimamanda Ngozi Adichie", "Naijiria", "Ikike ụmụnwanyị", "Abuja", "Afịrịka", "Ụmụnyanyị", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43341168
'Anyị na-achọ dinta gburu enyi'
A katọọla agwa dinta gburu enyi na Ondo steeti kpara.
2018-03-09T11:46:41Z
Ondo Steeti: Anyị na-achọ dinta gburu enyi
Enyi Enyi so anụmanụ a na-achọ achọ n'ụwa niile Gọọmenti Ondo steeti ekwuola na ha na-achọ otu dinta a kpọrọ Ọjaja onye gbagburu enyi n'ohia dị na Idanre, Ondo steeti. Akụkọ kwuru na ọha obodo gbakọrọ ikiri anụmanụ dị ụkọ ebe ọ tọgbọ n'ozu mana ka ndị nta na ndị obodo ya na-ana ya aka nọ o bu dimkpa, ndị mara ihe a na-ekwu n'obodo kwuru na ihe o mere jọgburu udele, sigbuo nkapị. Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ihe nwoke ahụ mere n'igwe okwu, Twitter. Onyeisi ngalaba n'ahụ maka ichekwa anụmanụ nke a kpọrọ Nigeria Conservation Foundation na bekee bụ Joseph Onoja kwuru na ihe dinta ahụ mere bụ ihe mwute. "Ọ bụ ihe mwute n'ihi na enyi ahụ sọ na enyi ohịa ole ma ole fọrọ n' Ọdida-Anyanwụ Naijiria." "Ihe ọ mere bụ ihe megidere iwu nke ọ kwesiri inwe ntaramahụhụ iji kwusụsị ụdị ihe ime ọzọ." Gee ihe Joseph Onoja kwuru n'uju na bekee: Kọmishọna ahụ na-ahụ maka ọnatarachi nke a kpọrọ 'Natural resources' na bekee n' Ọndọ na steeti bụ Rasheed Badmus tụrụ arịrị maka ihe mere ma kwuo na gọọmentị na-achọ nwoke ahụ iji taa ya ahụhụ ya. "Ihe mere na Idanre. Anyi amatabeghị ebe ọ mere kpọmkwem. Anyi akpọkọtala ndị ọrụ nchekwa na ndị dịnta ka ha nye aka chọta nwoke ahụ. A ga-ata ya ahụhụ n'ihi na ihe o mere bụ ihe iwu mabidoro." Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Femi Joseph gwara BBC na n'ezie na ya bụ ihe mere. O kwukwara na ha ji foto nwoke ahụ na-achọ ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Hapụrụ anyị ụmụ anyị - Aisha Buhari World Cup ga-atụ na BBC Lagos Arsene Wenger ọ ga-ekuru ume ndụ ugbua? N'ala Naijiria, dịka ọmenaala ọtụtụ siri dị, a na-ahụta onye gbụrụ enyị dịka dike. Mana otu onye na-agba mbọ maka nchekwa ikike dịrị anụmanụ bụ Desmond Majekodunmi kwara BBC na omenaala ahụ ewuchala, na 'ọ dịghị mma.' Majekodunmi kwuru na omenaala ochie na ndụ agba ọhụrụ dị iche ma rịọ ka gọọmenti gbalịa ikuziri ndị mmadụ mkpa ọ dị ichekwa anụmanụ ndị nwere ike mkpochapụ.
[ "Anụmanụ", "Naijiria", "Ikike dịrị anụmanụ", "Ondo steeti", "Ọdịmma anụmanụ", "Nchekwa ọhịa na anụmanụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43341171
Otu nwoke egbuola nwunye ya n'Enugwu
Aka ndị uweojii akparala nwoke kụgburu nwunye ya n'Enugwu
2018-03-09T14:47:36Z
Ndị uweojii Enugwu anwụchiela nwoke gburu nwunye ya
Onye a kụrụ ịga A nwụchiela nwoke ahụ kụgburu nwunye ya Otu nwoke a kpọrọ Sunday Nnamani akụgbuola nwunye ya, n'Enugwu, Enugwu steeti. Akụkọ kwuru sị na izụụka gara aga, Nnamani na nwunye ya bụ Nkechi nwere nghọtahie ebe ọ nọ kunye ya ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma. E bugara ya n'ụlọọgwụ Parklane Specialist Hospital, Enugu, ebe ọ nọrọ na-enwe nleta tupu ọ nwụọ ụnyaahụ. Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada Nwoke mara nwa ya aka ntị A nwuchiela onye gbara ndị mbịarambịara si Afrịka egbe Mgbe BBC gbara ya ajụjụọnụ n'ekwenti, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ SP Ebere Amaraizu, kwuru n'ezie na ọ bụ ihe mere eme. "Ọ bụ eziokwu. Mana ọ bụ izuụka gara aga ka nwoke ahụ na nwunye ya nwere okwu o were ihe kụọ ya n'isi. E buga ya ụlọọgwu ma ọ nwụrụ ụnyaahụ." Amaraizu gara n'ihu kwuo na aka ndị uweojii Enugwu steeti akparala nwaamadi ahụ, ebe o sokwa enyere ha aka na nyocha ha na-eme maka ọdachi ahụ. Ka ọ dị ugbua, e tinyela ozu nwaanyị ahụ n'ụlọozu.
[]
https://www.bbc.com/igbo/43355300
E gbuola mmadụ 11 na Plateau steeti
Ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi egbuola mmadụ iri na otu na Miango na Ganda dị na Plateau steeti.
2018-03-10T09:07:10Z
Na Plateau steeti e gbuola mmadụ 11
Nwata Fulani na-achị ehi Nsogbu Fulani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo atala isi ọtụtụ ndị mmadụ na Naijiria N'ụzụ ụtụtụ ụnyaahụ bụ Fraide 9 ọnwa Maachi, ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi gburu opekata mpe mmadụ ise na Miango nke dị n'okpuru ọchịchị Bassa. Ha gbukwara mmadụ isii n'ime obodo Ganda dị na Dafu nke dị n'okpuru ọchịchị Bokkos ndị dịcha na Plateau steeti. Ha gbakwara ụlọ karịrị ụlọ irị ise ọkụ ma merụkwa ọtụtụ ndị mmadụ ahụ. Nke a na-eme ka onyeisiala bụ Muhammadu Buhari sepụchara ụkwụ njem ọ gara na steeti ahụ ebe ọ gara mepe ngalaba steeti ahụ na-ahụ maka ikpa udo. Ọnụ na-ekwuchitere otu ndị ntorobịa n'obodo ahụ bụ Lawrence Zongo, kwuru na mmadụ ise egburu ebe ahụ gụnyere: Illa Isa Peter bụ onye gbara afọ 52, Henry Audu afọ 25, Emmanuel Joseph dị afọ 16, Christopher Joseph, afọ 16 na Peace Joseph dị afọ isii. Atọ n'ime ndị a bụ ụmụnne nke abụọ bụ ejima. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmenti etiti ewetuola mbubata osikapa 'Anyị na-achọ dinta gburu enyi' Chioma Akpotha: Ime ihe nkiri bụ akara aka m Onyeisi ndị Irigwe Development Association (IDA) bụ Sunday Abdu, gwara ndị ntaakụkọ na Jos, na iihe mere na mwakpo Miango bụ eziokwu. Abdu sịrị: "Ọ bụ eziokwu na ndị Fulani na-achị ehị gburu mmadụ ise na Miango na mwakpo bidoro n'abali Tọọsde ruo chi ofifo ụnyaahụ(Fraide). "Ndị ọzọ bụ ndị emerụrụ ahụ na mwakpọ ahụ e nweghị onye chọrọ ha okwu. E bugala ozu ndị ahụ n' ụlọọzụ dị n'ụlọọgwụ. Anyi anaghịzi akụ gbanụgbanụ ili ndị nke anyị egburu. Oge ọbụla anyị kwadoro ili ha, anyị ga-eme ka ndị mmadụ mara. "Ndị na achị ehi na-egbusịsị anyị mana ọ bụ ha bụ ndị na-ebenụ. Kedụ ụdị agụgọ dị otu a? Anyị na-arịọ ndị ọrụ nchekwa ka ha tinyekwuo uchu n'ọrụ nche iji kwụsị mbibi na ịla ndụ n'iyi na-aga n'ihu." Otu onye ndu ndị obodo na Bokkos bụ Matawa Mankut, kwetakwara na ihe mere n'obodo Ganda ụnyaahụ bụ eziokwu. Mankut sị: "Anyị nọ n'ili ozu ugbua iji likọta ndị e gburu. Anyị na-arịọ steeti na gọọmenti etiti ka ha gbatara anyị ọsọ enyemaka iji chekwa ndụ anyị na ihe anyị nwere n'ihi na ndị a na-achọ ikpochapụ anyị." Ọnụ na-ekwuru otu ndị agha nchekwa nke a kpọrọ 'Operation Safe Haven' bụ Majọ Adam Umar, kwuru na ihe e kwuru mere ma kwukwa na mgbe ndị mmadụ titara ha mkpu akwa na ha mere ngwa nwgwangwa zaa ha oku. Umar kwuru na mgbe ha rutere na ndị mwakpo ahụ agbalagala. Ọ gara n'ihu kwue na ndị agha ewerela ọnọdụ na mpaghara ahụ ma gwakwa ndị mmadụ ka wetara ha ozi ngaghari mmadụ maọbụ ihe na-edoghị anya.
[ "Naijiria", "Plateau steeti", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43341169
'Baba oyoyo' ọ pụtara 'Baba bịa ọzọ'?
Nnukwu nnabata e nyere Muhammadu Buhari na Plateau steeti nsonso apalitela ndọrịtaụka na ọ ga-emeri ma ọzọ ọchịchị n'afọ 2019.
2018-03-10T19:29:52Z
Plateau Steeti: 'Baba oyoyo' ọ pụtara Buhari bịa chịa anyị ọzọ?
Muhammadụ Buhari Muhammadụ Buhari kpọpere trakụtọ nari anọ oge o mere njem na Plateau steeti Ndị mmadụ nupụtara n'igwe ịnabata onyeisiala bụ Muhammed Buharị oge ọ gara njem nleta na Plateau steeti na nsonso. Ọtụtụ ha pụtara n'ezi dị n'ụzọ ebe ewumewu ndị Buhari gara imepe dị na-eti, 'Baba oyoyo,' na-efere ya aka. Agwa ha kpasara Buhari tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ na anya dịka e nwerela ọtụtụ ndị ọnụ na-eru na okwu dịka Olusegun Obasanjo na Ibrahim Babangida na Naijiria ndị katọrọ Buhari maka etu akụnaụba na nchekwa ala Naijiria siri kụọ afọ n'ala, ma gwa ya ka ọ hapụ ịzọ ọchịchị ọzọ n' afọ 2019. Mana ụdị nnabata e nyere ya na Plateau steeti palitere ndọrịtaụka n'etiti ndị mmadụ. Ndị hụrụ Buhari n'anya na-ekwu na ogosiri na Buhari ka bụ mmadụ oha, onye a hụrụ na-anya nke ukwu nke na ọ zọ ọkwa ọchịchị na afọ 2019, a ga-atụnyere ya akwụkwọ. Ha sị na o nwere ezi ohere inweta ọkwa onyeisiala ọzọ. Lee ihe ndị hụrụ Buhari n'anya na-ekwu n'igwe okwu Twitter: Mana ndị ọzọ na-ekwu na ịpụta n'ụzọ na-eti mkpu,efe aka abụghị ụzọ e ji ama onye ọha hụrụ n'anya, kama ọ bụ ntụliaka ga-ekwu onye bụ onye. Nwafọ Igbo ma bụrụkwa onye otu pati UPP bụ Chekwas Okorie sịrị na ihe ọtụtụ ndị mmadụ ji pụta bụ na ndị mmadụ na-apụtakarị ịbịa hụ ndị ọchịchị. O kwukwara na e nwe ọbịa pụrụiche, na gọọmenti ụfọdụ na-emechi ahia, ụlọakwụkwọ na ụlọọrụ. Akụkọ ga-amasị gị Uhuru Kenyatta na Raila Odinga ekpeziela Gọọmenti ga-egbubilata osikapa a na-ebubata E gbuola mmadụ 11 na Plateau steeti Okorie gara n'hu kwuo na nke a apụtaghị na onye ahụ ga-emerị na ntuliaka. " Ọ bụghị ikwụ n'ụzọ na-efe aka ka a ga-eji mara onye a ga-etinyere akwụkwọ na ntụliaka, ọ bụ nkwa e kwere ekwe nke e meghị ka a ga-atụle." Ndị na-agba mbọ ka ndị mmadụ nweta ikike dịrị ha kwenyere n'ihe Okorie kwuru. Otu onye n'ime ha bụ Jude Ohanele sị na ndị na-apụtakarị ma ndị ọchịchị bịa njem bụ ndị enweghị ọrụ. "Onye ọbụla bụ onye ọchịchị gara n'obodo dịka Naijiria obodo ndị mmadụ na-enweghị ọrụ, ndị mmadụ ga-apụta. Ọ bụrụ na ndị mmadụ nwere ọrụ, ha agaghị apụta. Oke ndị mmadụ pụtaranụ na-egosi ndị anamachọọrụ." David Anyaele kwuru na ọ bụ n'oge ntuliaka ka e ji ama onye ọha hụrụ n'anya n'ezie. N'okwu ya, "Agaghị eji etu ndị mmadụ siri gbapụta kele onye ọchịchị mara onye ga-atunyere ya n'ihi na ihe ndị a niile e nwere ike ịzụta ha n'ahịa." Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmentị etiti ana-akpachị mgbasaozi? Naịjirịa e nwere ndị nkuzi ha ga-ebinye Liberia? Ntuliaka Italy: Etu osi gbasa gị
[ "Naijiria", "Plateau steeti", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43359517
2019: 'Ndị Igbo akwadoghị Buhari'
Ụfọdụ ndị ndu Igbo n'otu ndọrọndọrọ ekwuola na nkwado ha adịghị n'ebe Buhari nọ maka ntuliaka afọ 2019.
2018-03-10T20:07:35Z
2019:Ndị Igbo akwadoghị Buhari
Mohammadu Buhari achịla Naịjirịa dịka onye agha na onye ọdịnala. Mohammadu Buhari achịla Naịjirịa dịka onye agha na onye ọdịnala. Ụfọdụ ndị ndu n'ala Igbo akatọọla akụkọ sịrị na ọ bụ ma Onyeisiala Mohammadu Buhari o were ọchịchị n'afọ 2019 ga-eme ka onye Igbo nwe ike ịchị n'afọ 2023 kwuo na ọ bụ okwu ọnụ ụtọ. Onyeisi otu pati United Progressive Party (UPP) bụ Chekwas Okorie gwara BBC Igbo na mkpebi a abụghị maka otu pati, na ọ bụ dịka ụmụ afọ Igbo ha bụ. O kwuru na onweghị etu pati na-ama ọchịchị aka n'ihu ga-eji hapụ otu nke ya bịa na-akwado ọchịchị ọ na-ama aka n'ihu. Okorie kwuru na ọ na-ekwuputa uche nke ya, mana ebe ọ bụ na ndị ọzọ na-ekwu otu ihe ahụ, ọ pụtara otu ihe a metụtara onye ọbụla dịka ndị Igbo. Gee ihe Chekwas Okorie kwuru ebe a; Ndị ndu n'ala Igbo ndị ọzọ katọrọ atụmatụ ahụ gunyere; onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ ABC Nwosu, onyeisi ọhanaeze ndị Igbo n'oge gara aga bụ Dọkịta Dozie Ikedife, onyeisi ndị Sịnetị mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Enyinnaya Abaribe nakwa onyeisi ndị Eastern Consultative Forum(ECA) bụ Elliot Ugochukwu-Uko. Cheta n'oge gara aga, otu onye na-agbasa ozi maka onyeisiala na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Osita Okechukwu kwuru na Buhari bụ otu ụzọ pụtara ihe ndị Igbo ga-eji nweta ọchịchị onyeisiala. O kwuru na Buhari e merela ndị Igbo oke ihe kwesiri iji rita mkpụrụobi ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 'Onweghị ndị ga-elere Ahiara Katolik Diocese anya' 'Baba oyoyo' ọ pụtara 'Baba bịa ọzọ? Uhuru Kenyatta na Raila Odinga ekpeziela
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-43361966
Serena na Venus Williams ga-asọmpi
Serena na nwanne ya nwaanyị ga-ezụko na asompi Indian Wells na nzụkọ ihe nrite nke 29 ha ga-agba.
2018-03-11T07:18:19Z
Serena na Venus Williams ga-asọmpi n'Indian Wells
Serena na Venus Williams Serena na Venus Williams ga-ezukọ n'asọmpi nke nrite nke 29 Onye a ma ama n'asọmpi tenis na mbaụwa bụ Serena Williams na nwanne ya nwaanyị Venus ga-apịa n'agba nke atọ na Indian Wells. Nke a bụ dịka Serena laghachitara kamgbe ọnwa iri na anọ ọ pụrụ ịga mụọ nwa ya nwaanyị. Serena agbaghị tenis n'ọnwa 14 ndị ahụ, mana o meriri Kiki Bertens bụ onye Nedaland 7-6 (7-5) 7-5 n'agba nke abụọ ha. "Ihe niile bụ nrite," Serena kwuru ka o nwere mmeri n'ime otu elekere na nkeji 52. Nwanne abụọ a zutere n'ikpeazu n'afọ 2017 mgbe ha gbara na mgbacha Australian Open bụ mgbe Serena ritere iko Grand Slam nke iri abụọ na atọ ya. Mgbe o meriri Venus na Melbourne, Serena di ime ada ya bụ Alexis Olympia nke ọ mụrụ n'ụbọchị mbụ nke Septemba 2017. Asọmpi a ga-abụ nke ugboro 29 ụmụnne a ga-ezụkọ n'asọmpi nrite. Serena meriri ugbo 17 n'ime ugbo 28 ha gbabugoro. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gọọmentị etiti ana-akpachị mgbasaozi? Naịjirịa e nwere ndị nkuzi ha ga-ebinye Liberia? Ntuliaka Italy: Etu osi gbasa gị
[ "Egwuruegwu", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43362079
Agbapụtala mmadụ iri ise na mmiri
Gbanyeghi ahụhụ ndị mmadụ na-ata na Libya, ọtụtụ ndị mmadụ ka na-etinye isi n'ụzọ ihe ize ndụ ịga Europe.
2018-03-11T18:51:03Z
Agbapụtala ndị Naịjirịa 50 sị Libya aga Italy na mmiri
Ndị mbịmbịa nọ n'elu mmiri Gọọmenti naịjirịa kpọlatara ọtụtụ ndị Naịjịrịa a na-ata ahụhụ na Libya n'ọnwa Jenuwarị Ihe ruru mmadụ iri ise ka a gbapụtara na orimiri Mediterranean ụbọchị Satọde dịka ha na-achọ ibanye mba Itali dị Libya. Ndị nyere ha aka bụ ndị nchekwa nọ n'akụkụ mmiri na Libya, ndị ọrụ enyemaka na ndị dọkịnta na-akpagharị akpagharị a kpọrọ Doctors (MSF) without Boarders na aha bekee. Ndị Naịjirịa ahụ nọ n'elu ụgbọ mmiri gunyere ndị mbịmbịa mmadụ otu narị na iri ndị ọzọ oge a gbapụara ha. Ndị isi obodo ahụ kwuru n'ụgbọ ahụ ekpuchala na mmiri tupu ha erute ebe ha nọ. Dịka ndị MSF siri dee n'akara ha na twitter, ha kwuru na ebe obi kopụrụ ụfọdụ nime ha, onweghi onye meruru ahụ dịka ha gbapụtasịrị ha niile. A ghara ndị Naịjirịọ́ sọ na ndị ahụ, ndị ọzọ si obodo ndị dị na mpaghara Afrịka ndị ọzọ. MSF ga-akpọ ha gaa ItalI dịka ha na-ekwu na ụgbọ mmiri ha ga-anọ na-agbapụta ndụ mmadụ ma nyere ha aka. Mana ndị ọrụ nchekwa Libya jidere, ha na-akpọghachi ha Libya maka na otu EU nyere ha ikike ịkwụsị ndị mbịambịa ibanye mba dị na Europe. Libya bụ isi obodo ndị mbịmbịa na-esi abanye Europe. Ọtụtụ ndị mmaọ̄ụ anwụọla n'ụzọ nakwa n'elu mmiri Mediterranean dịka ha na-achọ ịga Europe. Gọọmeti Naịjirịa na gọọmenti ndị ọzọ dị n'Afịrịka ebidola mgbasaozi iji kpọlata ndị tọrọ atọ na mba Libya. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mmadụ 136 esịla Libya laghachịte Mmadụ iri itoolu emiela mmiri na Libya Ntuliaka Italy: Etu osi gbasa gị
[ "Europe", "Naijiria", "Njepụ", "Njepụ", "Ọgbakọ nke Europe", "Libya" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43369493
Ndị Benue apụtaghị nabata Buhari
Ndị mmadụ apụtaghị nabata Buhari oge ọ gara Benue maka ịleta ndị e gburu ndị nke ha n'ọgbaghara dị n'etiti ndị Fulani na-achị ehi na ndị ọrụugbo.
2018-03-12T16:20:05Z
Benue: Njem Buhari a adighị ka nke Plateau
Okporo uzo n'obodo Ndị Benue nwereike ị na-ewe iwe maka oge onyeisiala gburu ị bịa leta ha Onyeisiala Buhari mere njem na Benue steeti maka isoro ha rue ụjụ maka ndị nwụrụ n'ọgbaghara ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo. Mana nnabata ya adịghị ka mgbe ọ gara Plateau steeti dịka okporoụzọ niile tọgbọ chakoo ka onyeisiala bịara n'obodo ahụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ a pụtaghị bia zute ya. Benue a kagbuola NYSC Achọtala ndị uweojii furefu na Benue steeti Ndị uweojii anọ efuola na Benue N'okwu ya o kwuru na mwakpo na-emekarị na Benue bụ ihe na-eme gọọment obi ọjọọ, ma kwe nkwa na gọọment ga akwụsi ya. "Agaghị m eleghara gbuogbuogbuo na-eme na Benue n'akụkụ Naijria ndị ọzọ.mwakpo na-emekarị na Benue na eme m obi ọjọọ. Anyị na-agba mbọ ime ihe niile iji kwụsị ya." Ka akụkọ a na-apụta, ndị Miyetti Allah ji ohere ahụ na-arịọ mgbaghara maka ihe mere n'etiti ha na ndị ọrụụgbo n'obodo dị iche iche na Benue steeti. Ọtụtụ mmadụ kwuru na njem Buharị na Benue abiaghi no oge Cheta n'ịzụka iri garaga n'ime obodo Logo na Guma ndị ji egbe ha ana-ebo na ha bụ ndị ọchịehi gburu ọtụtụ ndị ọrụụgbo n'ime obodo di iche iche na Benue steeti. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Uru a dị n'irụ ụzọ njikọ n' ọwụwa anyanwụ? Frank Wolf: Boko Haram na Naịjirịa ga-akwusị Rwanda: Amụmaigwe egbuola ndị ụlọụka
[ "Boko Haram", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Benue steeti", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43352924
Ihe ise masịrị ụmụnwaanyị
Anyị ga-ahụ ihe ise masịrị ụmụnwaanyị ndị Igbo na ndị ọzọ.
2018-03-12T16:43:08Z
Ihe ise masịrị ụmụnwaanyị
Okpu ụmụ nwaanyị abụọ Ọtụtụ ihe na-amasị ụmụnwaanyị Nrị dị nma, ịchọ nma, ego, ezumike, ụmụaka, alụmdinanwunye, mmekọrịta ha na enyi ha...ihe masịrị ụmụnwaanyị karịrị akarị. Mana ugbua anyị ga-akọrọ unu ihe ise kachasị amasị ụmụnwaanyị, ọkachasị ndị Igbo: Ha anaghị eji ụmụ ha egwu egwu makana ezinaụlọ ha dị oke mkpa. Ụmụaka ha bụ ihe mbụ na ndụ ha. Ụmụnwaanyị ala Igbo bụ oriakụ na-achọ ebe ahụ ga-adị ha mma "Ahụ chọrọ nhicha" ụmụnwaanyị adịghị achọ mmekpa ahụ. Ha chọrọ ka ha kee ekike dị mma Ụmụnwaanyị Igbo na-eji ejiji dị mma ọge ọbụla. Ụmụnwaanyị ala Igbo na-achọ ụmụnwoke na-agba mbọ Ihe ọbụla nwoke tinyere aka na ya, nwaanyị Igbo ga-akwado ya. Ha na-achọ itinye aka n'ọrụ ogeọbụla, ha anaghị achọ ịnọ nkịtị Ihe niile nwaanyị chọtara ime, ọ ga-eme ya ọfụma. Akụkọ ndị ga-amasị gị: INEC kwenyere n'igwe 'card reader' China emela Xi onyeisiala ruo n'ọnwụ Rwanda: Amụmaigwe egbuola ndị ụlọụka
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-43383246
Onwere ihe Buhari ga-eme Ibrahim Idris?
Buhari kwuru na ugbua ka ọ nụrụ na Idris anọghị na Benue steeti.
2018-03-13T10:19:55Z
Ibrahim Idris nwere ike ịza ajụjụ n'aka Buhari
Ibrahim Idris Ndị uweojii na ndị agha enwebeghị ike ịkwusị ogbugbu mmadụ na Benue steeti Obi mebiri ọtụtụ ndị mmadụ oge onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari kwuru na ọ tụrụ ya n'anya na aka na-achị ndị uweojii bụ Ibrahim Idris nupuru isi n'iwu o nyere ya. Buhari gwara Idris ka o biri na Benue ruo mgbe a ga-akwụsị igbu mmadụ na steeti ahụ. Mana Idris nọrọ na Benue nanị mkpụrụ ụbọchị ole na ole tupu ọ laghachị Abuja. Ndị Benue apụtaghị nabata Buhari Ndị uweojii anọ efuola na Benue Na nleta Buhari biara ịleta ndị Benue ụnyaahụ, o kwuru na o juru ya anya na Idris mere ụdịrị ihe a. Mana ndị okachamara BBC kpọrọ n'elu ekwentị kwuru na ọ rara ahụ ikweta na onyeisiala obodo amaghị ebe onyeisi ndị uweojii nọ mgbe niile, maọbụ ebe ọ nọ arụ ọrụ. Larry Oguego bụ onye ọkachamara gwara BBC Igbo na ọ bụ ihe ihere na ihe a na-eme na Naịjirịa. O kwuru sị "n'uche m onyeisiala anyị maara na Idris anọghị na Benue, ihe eji sị Idris gawa Benue n'oge mbụ bụ maka mkpu ndị Naịjirịa na-eti." Gee n'uju ihe ọkammụta Larry Oguego kwuru maka okwu nke a. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọgbaaghara na-ada n'ụlọ Ojukwu 'Anyị ga-eji mkparịtaụka tọpụta ụmụakwụkwọ 110 a tọrọ'
[ "Boko Haram", "Naijiria", "Benue steeti", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43384497
Onyeara egbuola ụmụakwụkwọ abụọ
Akụkọ na-ekwu na onyeara gburu ụmụakwụkwọ abụọ n'Ogun steeti.
2018-03-13T12:12:39Z
Onyeara egbuola ụmụakwụkwọ abụọ na Ogun steeti
Otu onye nwere isi mgbaka Naịjirịa enweghị otụtụ ụlọogwụ na-agwọ ndị nwere ọrịa isi mgbaka Ilu Igbo kwuru na ndị ọrụaka ụgbọala (mekanik) ekweghị mmadụ mara onye isi dị nma na onye isi mebiri emebi. Ilu nke a na-abia ka otu onyeara akpọrọ Lekan Adebisi gara n'otu ụlọakwụkwọ akpọrọ St John's Anglican Primary School Agodo dị n'Ogun steeti gbuo ụmụakwụkwọ abụọ. Aha ụmụaka abụọ ahụ bụ Mubarak Kalesowo na Sunday Obituyi. Ha abuọ dị afọ anọ, nọcha na klasị ọtaakara. Mberede okporoụzọ egbuola ụmụakwụkwọ 21 Mwakpo Yobe: Ụmụakwụkwọ abụọ anwụọla Ụmụakwụkwọ ruru 17 anwụọla n'Amerịka Akụkọ kwuru na onyeara a batara n'ụlọakwụkwọ a mgbe ụmụaka na-aga egwuregwu, wee kpaa mkpamkpa a. Ugbua, onweghị onye mara ebe Adebisi nọ maka na ọ gbara ọsọ oge ọ magburu ụmụakwụkwọ a. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ogun steeti bụ Abimbola Oyeyemi gwara BBC na ndị uweojii na-achọ ya achọ n'ebe niile ugbua. O kwukwara na ndị uweojii agaala n'ụlọakwụkwọ ihe mberede a mere maka ime ka udo laghachịta. Gịnị ka ha ga-eme Adebisi? Ihe kachasị ndị uweojii mkpa ugbua bụ ijide ya n'aka. Oyeyemi kwuru na ndị uweojii anaghị akpọ Adebisi 'ogbummadu' ugbua maka na ha ka na-achọ ịchọpụta ihe mere o jiri kpaa mkpamkpa a n'isi mbido. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onwere ihe Buhari ga-eme Ibrahim Idris? Ọgbaaghara na-ada n'ụlọ Ojukwu
[ "Mmegbu", "Naijiria", "Ogun steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43390145
Plateau: Ndị ọchịehi egbuola mmadụ 25
O rubeghị otu izuụka Buhari bịara ị leta ndị Plateau steeti ka mwakpo mere n'obodo ha ọzọ.
2018-03-13T17:14:59Z
Plateau: Ndị ọchịehi gburu mmadụ 25 na mwakpo ọhụrụ na Plateau
Nwaanyị na-ebe akwa Ndị Plateau sị Buhari ya ritue n'ọkwa ọchịchị Ndị e chere na ha bụ ndị ọchị ehi egbuola ihe ruru mmadu iri abụọ n'ise na Plateau steeti na mpaghara ugwu Naịjiria. Ọnọọgụgụ na-ekwu na ndị nwụrụ n'ihe a bụ nwoke iri n'itoolu, ụmụnwaanyị atọ na ụmụaka atọ na ebe ahụ. Onye na-ekwuchitere ndị uweoji ọnụ bụ Matthias Terna sị na ndị malietere ị gba egbe ma ị gbakwa ọtụtụ ụlọ ọkụ n'abalị ụnyaahụ. Matthias sị kwa na ọ bụ n'obodo Dundu na Kwall ebe Plateau steeti na Kaduna steeti nwere oke ala ka ihe a mere. E gbuola mmadụ 11 na Plateau steeti 'Baba oyoyo' ọ pụtara 'Baba bịa ọzọ'? Ndị Benue apụtaghị nabata Buhari Onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara nchekwa achọghị ka akpọ aha ya sị na anyị kwesiri iji aka ike soro ndị mwakpo a. Ọ sị na ọbụ ihe mwute na ihe a mere n'ọtụtụ ụbọchị gara ebe Buhari gara i leta ndị ụdị mwakpo a metụtara mbụ. Onye ọkachamara ahụ gwakwara BBC n'ihe a gosiri n'uche onyeisiala Buhari adịghị n'ihe na-eme n'ala. Matthias bụ onye na-ekwuru ndị uweoji sị na o nwere atụmatụ ndị agha na-eme n'obodo Plateau steeti a na-akpọ 'Operation Safe Haven' n'asụsụ bekee Ọ sị naọbụ ndị agha na ndị uweoji jịkọrọ aka na-emepụta atụmatụ a. Terna ji kwa ohere a na-ekwu na ha kwesiri ị nweta ndị mmadụ ọzọ ga-enyere ha aka gbochie ụdị mwakpo a ime ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Trump achụọla Rex Tillerson n'ọrụ Onyeara egbuola ụmụakwụkwọ abụọ Ọgbaaghara na-ada n'ụlọ Ojukwu
[ "Naijiria", "Plateau steeti", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43397299
Buhari agbaala Idris ajụjụ maka nnupuisi
Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari a gwala onyeisi ndị Uweojii ka ọ kọwa ihe mere ọ jiri nupuisi n'ọkwa o nyere ya.
2018-03-14T08:23:12Z
Buhari: Gịnị mere i jiri gbahapụ Benue Steeti?
Ibrahim Idris were ọchịchị onyeisi ndị Uweojii n'ọnwa Maachị afọ 2016 Ibrahim Idris were ọchịchị onyeisi ndị Uweojii n'ọnwa Maachị afọ 2016 Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari gwara onyeisi ndị Uweojii bụ Ibrahim Idris ka ọ wuchie n'isi ọchịchị dị na Abuja, bịa kọwa ihe mere oji gbahapụ Benue Steeti. Mgbe Idris wuchiri n'Aso Villa ụnyaahụ, Onyeisiala gbara ya ajụjụ ihe mere o ji nupuisi n'iwu o nyere ya ka ọ kwakọrọ ngwongwo ya laa Benue Steeti. Oge mkparịta ụka ha nọrọ nkeji iri atọ, ebe onyeisiala na-abatara ya n'ime ụlọ n'onweghi onyeọzọ nọọ ya. Onyeisi ndị Uweojii hapụrụ isi ọchịchị bụ Aso Villa na-atụpụrụghị onye ọ bụla ọnụ oge mkparịta ụka ha gụrụ. Onye enyemaka pụrụiche na mgbasa ozi nke ọnyeisiala bụ Garba Shehu kwuputara na mkparịta ụka ahụ bụ eziokwu. Shehu jụkwara ịkọwa ihe bụ isiokwu ụka ha, kwuo na ọ ka onyeisi ndị Uweojii kọwa ọrụ ya iji gbochie ọgbaghara dị na Benue Steeti. Cheta na mgbe onyeisiala mgbe ọ gara Benue kwuru na ọ bụ ihe iju anya nye ya na Idris anọghị na Benue Steeti dịka ọ nyere ya n'iwu. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Stephen Hawking anwụọla n'afọ 76 Buhari ajụla ibinye aka n'iwu ọhụrụ 'Anyị anaghị agba akwụkwọ ntuliaka ọkụ'
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Ọgụ ndị na-achịehi" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43412815
Buhari: A ka m Jonathan mma
Ọgụ ọnụ adaala n'etiti ndị nke Buhari na Jonathan maka ntọrọ ụmụakwụkwọ Dapchi na mpaghara ugwu nke Naịjirịa.
2018-03-15T11:33:30Z
Ụmụaka Dapchi: Ọgụ adaala n'etiti Buhari na Jonathan
Buhari bidoro njem nleta n'obodo ndị nwere ọgbaghara na Naịjirịa nke gunyere Taraba, Plateau, Benue tupu ọ gawa Yobe. Buhari bidoro njem nleta n'obodo ndị nwere ọgbaghara na Naịjirịa nke gunyere Taraba, Plateau, Benue tupu ọ gawa Yobe. Onyeisiala Mohammadu Buhari kwuru na ọ ka onye bụburu onyeisiala n'oge gara aga bụ Goodluck Jonathan mma na-ileba anya na ntọrọ ụmụaka akwụkwọ. O kwuru nke a ụnyaahụ mgbe o mere njem nleta n'obodo Dapchi nke Yobe Steeti, bụ ebe atọrọ ụmụaka ahụ n'ọnwa gara aga. Ọ katọrọ ọchịchị Jonathan na nleghara anya ụmụakwụkwọ Chibok mgbe atọrọ ha n'afọ 2014, ma kwuo na ọ bụ enweghị uche. Ụfọdụ ụmụakwụkwọ a bụ ndị atọrọ Mana Okwu Buhari a ebutela ọsịsa dị icheiche site n'aka ọtụtụ ndị mmadụ. Onye na-ekwuchite ọnụ ndị otu 'Bring Back Our Girls' bụ Sesugh Akume ekwuola na onyeisiala agbalịghị. Akume kwuru, "Obi adịghị anyị ụtọ, ihe a bụ afọ anọ atọrọ ụmụaka Chibok, ugbua o meela n'obodo Dapchi dịka ọchịchị Buhari na-eme otu njehe Jonathan mere n'oge nke ya." "O ruola otu ọnwa atọrọ ụmụaka ahụ, mana ugbu a ka Gọọmenti na-aga ebe ahụ." "Agbanyighị asị niile ha tụrụ na ha-agbapụtala ụmụaka Dapchi." Onyeisiala kwere ndị nne na nna ụmụaka Dapchi na ọ ga-agbapụta ụmụaka ahụ atọrọ Onye enyemaka pụrụiche nke Jonathan bụ Reno Omokiri kwuru na nwa Buhari bụ Yusuf Buhari nwere mgbuchi karịa ụmụaka Dapchi. O kwuru na oge atọrọ ụmụaka Chibok, Jonathan kpọrọ oku nzukọ ndị nchekwa, ebe Buhari kagburu nzukọ ndị nchekwa n'oge atọrọ ụmụaka Dapchi. O kwukwara n'oge Yusuf Buhari nwere ihe mberede okproụzọ na Buhari kagburu njem niile onwere, ma gawa ileta nwa ya n'ụlọọgwụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị mụrụ ụmụakwụkwọ Dapchi wuchiri Abuja Ndị mụrụ ụmụakwụkwọ Dapchi wuchiri Abuja Onye ọzọ kwuru uche ya bụ Femi Fani-Koyede na tuwita ya; Onye na-ekwuchitere Jonathan ọnụ bụ Reuben Abati kwuru nke ya na tuwita; Ụmụafọ Naịjirịa ndị ọzọ kwuru uche na tuwita;
[ "Boko Haram", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Yobe steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43369301
Uru ọmụgwọ n'omenala Igbo
A mụọ nwa ọhụrụ, e jiri azụ, ji mmiri ọkụ, ụda na ụtazị gaa leta nne mụrụ ya. Ya bụ ihe a kpọrọ ọmụgwọ.
2018-03-15T19:05:16Z
Ọmụgwọ ọ bụ omenala ga-akwụsị n'ala Igbo?
Nwa ọhụrụ na nne ya Ọmụgwọ bụ ọmenaala Igbo bidoro kemgbe gboo nke ka na-eme ruo ugbua Ile ọmụgwọ n'omenala Igbo bụ oge nne na-abịa ileta nwa ya nwaanyị na nwa ọ mụrụ (nke bụ nwa nwa ya). Ụfọdụ oge, ọ bụrụ na nwaanyị enweghịzị nne (ọ bụrụ na nne mụrụ ya anwụọla), nwunye nna ya maọbụ nne di ya ga-abị nọrọ n'ụlọ ya lee ya ọmụgwọ. Ihe ise masịrị ụmụnwaanyị Ụmụnwaanyị ewechighala isiowu n'ụdị ọhụrụ Uru nwaanyị abụghị sọ n'ụsọekwu Ihe mere o ji bụrụ nwaanyị na-ele ọmụgwọ kama nwoke, bụ maka na a na-ewe ya na ọ bụ nwaanyị kacha mara ihe gbasara ya maka na ọ gabigala ọnọdụ ahụ n'onwe ya. Oge ọmụgwọ bụ oge nne na-akụziri nwa ya nwaanyị ihe niile ọ ma maka ilekọta nwa a mụrụ ọhụrụ. Ụfọdụ oge, ọ na-abụ nne mụrụ nwa laa, nne di ya abịa bido lewe ya ọmụgwọ nke ya. Nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-eji ohere ọmụgwọ zuru ike ma nne ya na-elekọta nwa ya. Ihe nne na-eme n'ọmụgwọ Nne ga na-enye nwa ya nwaanyị ihe ga-eme ka mmiri ara ya gbaa ọfụma Nne ga na-esiri ya nri ndị ga-eme ka ahụ ya gbakee ọfụma Nne ga na-ama ya mmiri ọkụ n'afọ na ebe ndị ọzọ ọ chọrọ, ma tekwaa ya ihe ga-ekpo ya ahụ ọkụ (robb, aboniki) Nne ga na-enye nwata ọhụrụ nri, saa akwa ya ma saa ya ahụ Ọ ga-adọtịkwa nwa ọhụrụ ahụ, ma hịa ya aka n'ahụ ọfụma Ọ ga na-ahụ na nwa ya nọ ala n'elu bọketị awụnyere mmiri ọkụ na nnu na ọgwụ eji achụ nje, nke ga-eme ka ọbara ọjọọ nwee ike gbapụta Ọ ga na-ekekpa ya afọ ka o nwee ike taa ma hara etu ọhabu tupu ọ dị ime Nne ga na-agba nwa ya nwaanyị ume maka na ya na onwe ya anọọla n'ọnọdụ ahụ mbụ Ọ ga na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ dị n'ụlọ dịka ihazi ụlọ na isi nri ezinaụlọ na-eri Uru ọmụgwọ bara Ọmụgwọ bụ oge nne, nwa ya na nwa nwa ọhụrụ ya na-eji enwe ezigbo mmekọrịta nke bekee kpọrọ 'bonding'. Maka nke a ka ọtụtụ ndị nne na-eji aga ebe ọbụla nwa ha nọ mụọ nwa, ma n'ụlọ maọbụ na mba ofesi, ịga nọkọọ ihe ruru ọnwa atọ maọbụ karịa. Ọ ga-akuzikiri nwa ya nwaanyị ihe ubeakwa nwa ya pụtara, maọbụ akwa agụrụ maọbụ akwa mmekpa ahụ. Nri ekwesịrị iri n'ọmụgwọ Nwaanyị a na-ele ọmụgwọ nwere nri ndị ọ na-eri. Ụfọdụ bụ iji asụchapụ ọbara kpụkọrọ ya n'afọ oge nwa nọ ya n'ime. Nri ndị a bụ ma mkpọrọgwụ ma ngwanri dị icheiche. Ofe mmiri ụda Ji mmiri ọkụ Ofe nsala Mmiri ọgwụ etere ete Tii dị ọkụ na akamụ Nri asụrụ asụ Nzu Azụ ọkpọọ na okporoko Anụ ọkụkọ Ụda Ehuru na ehu Ụzịza Ụtazị Nri ọbụla ga-enwe ezigbote ose A na-ekwu na ụda na-egbochi afọ ime na ọrịa ndị ọzọ dịka agbaikpere Nri nwaanyị ekwesịghị iri n'ọmụgwọ Ihe juru oke oyi Egwusi, ọgbọnọ na ofe ọbụla e ji mmanụ e si Ahuekere Nri ọbụla nwere abụba (nwaanyị anaghị eri ya maka na a na-ewe ya na abụba ga-akpụkọ ya n'afọ maọbụ n'ahụ) Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ụgwọ isi nwaanyị ọ dị mkpa taa? Ihụtụla nwaanyị gbara ajị ka nwoke? Ihe ise masịrị ụmụnwaanyị Kedụ ihe bụ ebumnuche gị maka ịgba mkpe? Ngwụcha ọmụgwọ Ọmụgwọ gwụ, nne bịara ọmụgwọ ga-enweta ihe buru ibu. Ndị ọ bịara ileta ga-azụtara ya ihe onyinye dị icheiche dịka ego, akwa ọmụma, akpụkpọụkwụ, akpa, ihe nri dị icheiche, wee dịrị gawazie. A ga-azụtara ya akpa nnu na akpa ncha nke ọ ga-eke ndị agbataobi ya ma ọ laruo ebe o bi.
[ "Naijiria", "West Africa", "Afịrịka", "Ụmụnyanyị", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43420822
"Anyị chọrọ udo na ikpe zuru oke"
Akụkọ kwuru na ụmụnwaanyị Ozubulu jiri ejiji ka ndị mkpe gara n'isi ụlọ ndị uweoji na Amawbia ị rịọ mkpuchi.
2018-03-15T19:11:40Z
Ụmụnwaanyị Ozubulu emeela ngosiputa
Ndị mmadụ bu egbe wakporo ndị ụka St. Phillips n'afọ gara aga Ụmụ nwaanyị Ozubulu nọ n'okpuru Ekwusigo na Anambra steeti gara n'ụlọọrụ ndị uweojii nke dị n'Amwabia ị rịọ ha mkpuchi ụnya ahụ. Ha mere nke a maka ịkpe dị n'etiti ndị echere na ha-wakporo ụlọụka dị n'obodo ha n'ụbọchị 6 ọgọstụ afọ gara aga. Ha sị na ndị a na-eyi ndụ ha egwu na ọ bụkwa n'ihi nke a ka ha na-achọ mkpuchi ndị ga-enye akaebe megide ndị wakporo ha n'ụlọ ikpe. Ha bu akwụkwọ nnukwu gaa-ebe ahụ edere "anyị chọrọ ịkpe zuruoke" "anyị chọrọ mkpuchi ndị uweoji n'ụlọikpe" Ihe onye akaebe kwuru maka ọchụ Ozubulu Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweoji na Anambra bụ Nkiruka Nwode gwara BBC Igbo na-ekwe ntị na ihe dị ụmụnwaanyị a mkpa bụ ka udo were ọnọdụ n'obodo ha. Nwode sị na ụmụnwaanyị a na-eme ihe a rịọrọ ndị uweoji mkpuchi ka ha na-akwado ịga ụlọikpe maka ụchụ e gburu n'obodo ha. Onyeisi ndị uweoji na Anambra steeti bụ Garba Baba Umaru nyere ụmụnwaanyị a nkwado, sị ha gaa n'iru. Umaru gwara ụmụnwaanyị ahụ na "ebe ọ bụ na m nọ ebe a, ọnweghị ihe ga-eme unu, m ga-ahụ na unu nwetara ikpe zuruoke". Ihe mere n'Ozubulu Ndị bu egbe gara n'ụlọụka St. Phillips nke ụsoro Katolik were gbagbuo ndị mmadụ ebe ha na-aka ụka Mwakpo a mere chịrị ndụ mmadụ 11 n'ụtụtụ Ọgọstụ 6 afọ 2017 Akụkọ sị na ọ bụ esemokwu n'etiti mmadụ abụọ bi na Mba Saut Afịrịka butere ihe a. Nke a mere ka ndị uweooji nke Mba Naịjirịa na Saut Afrịka bido nyocha n'ime okwu a Ndị eboro ebubo na ọ bụ ha kpara nkata ghọrọ ngịga n'okwu mkpamkpa ahụ mere bụ: Onyebuchi Mbanefo, 46, Chukwudi Ugwu, 30 na Great Chinedu Akpunonu, 44 Okwu a ka nọ n'ụlọikpe ebe ndị akaebe jisike na-apụta kwa ụbọchị Akụkọ ndị ga-amasị gị: Aruziwela ahịa Timbershade gbara ọkụ Uru ọmụgwọ bara n'omenala Igbo Egbuola ndịagha Naịjirịa abụọ na Plateau
[ "Naijiria", "Ụka ndị Roman", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43437269
'Ndị ụlọ anyị sị m ma alọtazina ụlọ ọzọ ma m ahụghị di'
N'ala Igbo, agbọghọ rue afọ iri atọ alụbeghị di na-enweta mkpalị, ikpa oke na nsogbu ndị ọzọ dị iche iche.
2018-03-17T10:26:44Z
'Agwa ndị mmadụ na-akpasa m maka alụghị di na-ewute m'
Ụmụagbọghọ na-eso nwaanyi na-agba akwụkwọ A na-emekpa ụmụagbọghọ na-alụbeghị di ahụ Nkiru (anyị etinyeghị aha nna ya dịka anyị siri kwe ya nkwa) dị ihe karịrị afọ iri atọ na-arụ ọrụ dịka onye na-anabata mmadụ n'ụlọọrụ ha dị na Lagos mana ọ lubeghị di. Nkiru gwara onye ntaakụkọ BBC na ọnọdụ ya na-ebutere ya mkparị, mmegbu, ịkpa oke na ihe obi ọjọọ n'aka ndị ezinaụlọ ya na ndịọzọ. "Oge ikpeazụ m gara ụlọ, ndị ụlọ anyị gwara m na m alọtazina ụlọ ma o buru na onweghị nwoke m ji aka lọta." Ọ tụrụkwara arịrị na nwanne nna ya (nna ya anwụọla) anaghị enye ya na nwanne ya nwaanyị oke ruru ha n'ihi na ha alubeghị di. Gee ihe Nkiru kwuru: 'Ndị ụlọ anyị sị m ma alọtazina ụlọ ọzọ ma m ahụghị di' N'ala Igbo, ịlụ di bụ ihe e ji agụ onye tozuru okenye Dịka nchọpụta nke ọnụọgụgụ na ahụike nke a kpọrọ 'National Demographic and Health Survey' na bekee e mere n'afọ 2013 siri gosipụta, n'ala Naijiria, ụmụnwaanyị dị bido afọ 15 rue afọ 19 lụrụ di dị pasentị 28.2, ebe ndị dị afọ 35 rue afọ 39 lụrụ di dị pasentị 89.4. Uru ọmụgwọ bara n'omenala Igbo Osu a ga-akwụsị n'ala Igbo? Nke a na-egọsị na ịlụ di bụ omenaala zụrụ agbụrụ ọnụ n'ala Naijiria. Mana ọ bụrụ na nwaanyị etoruo ogo ịlụ di ma ọ lughị, ọkachasị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naijiria, a na-elede ya anya, na-emekpakwa ụfọdụ ahụ, ọtụmadị ihe ha mepụtarala na ndụ. Ginị na akpata ya? Dika ndị ọkammụta n'ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke a kpọrọ 'sociologists' na bekee siri kọwa, ihe na-akpatakarị mmegbu maọbụ mkpagbu ụmụnwaanyị alụghị di bụ omenaala na enweghị ezi nghọta. N'okwu ya, Dr Adedeji Oyenuga bụ onye na-akụzi 'Sociology' na Lagos State University, kọwara na ọ bụ omenaala nakwa na ụfọdụ ndị nne na nna na-ahụ alụghị di nwa ha dika ihe na-egosi na ha azụghị nwa ha nke ọma. "O si na omenaala. O nwere oge nwata na-elekwasị nne na nna ya anya, mana mgbe nwata toro bụrụ okenya nọrọ onwe ya, a na-ele nwanwoke anya ịlụ nwaanyị ,na-ele nwanwaanyị anya ịlụ dị. ọ bụrụ na o meghị otu a, ọ kachasị na ọ bụrụ nwaanyị, nne na nna ya ga-ewe ya dịka na ha akụọla afọ n'ala n'ịzụlite ya." Dr Nkechi Emma-Echiegu bụ onye nkuzi na Ebonyi State University kwukwara na ọ bụ omenaala. "N'ala Igbo, ọ na-abụ ajụkata onye mụrụ, a jụwa onye na-alụ." Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ omenaala ọjọọ na a na-akparị maọbụ emegbu nwagbọghọ n'ihi alụghị di. Gee ihe o kwuru n' uju: Gịnị na-ebute alughị di n'oge: Dr Adedeji Oyenuga kwuru na ihe so akpata alụghị di n'oge bụ nwaanyị ịgụ oke akwụkwọ nke nwere ike ime ka ụmụnwoke gara ịlụ ya na-atu ya egwu. Ọzọ bụ na umunwaanyi kariri ụmụnwoke n'ọnụọgụgụ. O kwukwara na ụmụnwoke na-ahapụkarị ebe a mụrụ ha ga mba tere aka karịa ụmụnwaanyị nke mere na ịlụ onye ya na ya tokọrọ na-ara ahụ. Ihe ịkpagbu agbọghọ alụbeghị di na-ebute Dịka ọkachamara Oyenuga siri kwuo, oke megide nwaanyi alubeghị di na-ebute otutu ihe dịka oke mmanya, ịṅụ anwụrụike, ọnwụ ike , oke nchekasị nke ndị bekee kpọrọ,'depression', nke nwere ike ibute ọnwụ ike, ịkwụ ụdọ. Echiegu kwuru na o nwere ike ibute ọdachi dị iche iche gunyere oke echiche, agwa ọjọọ, ịlụ ajọ di, mkpafu na ọnwụ ike. Ha kwuru na ịnwe nghọta ga-enye aka ị kwụsị omenaala ọjọọ nke na-eme ka a na-ahụta nwaanyị alụbeghị di dịka onye enweghị iru ọ bara.
[ "Naijiria", "Ikike ụmụnwanyị", "Ụmụnyanyị", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/43440309
Nwaanyị ga-aga mkpọrọ maka ịlụ nwa ya
A tụọla otu nne nwaanyị mkpọrọ afọ abụọ maka ịlụ nwa ya nwaanyị n' Oklahoma dị na mba Amerịka.
2018-03-17T12:36:36Z
N'Oklahoma, otu nwaanyị ga-aga mkpọrọ maka ịlụ nwa ya
Patricia Ann Spann na nwa ya,Misty Dawn Spann Nwaanyị a lụbụrụ nwa ya nwoke Patricia Ann Spann, onye gbara afọ iri anọ na ise kwetara na ya na nwa ya nwaanyị bụ Misty Velvet Dawn Spann dị afọ iri abuo na isii, gbara akwụkwọ ma nwe mmekọrịta ndị bụ ọbara ya. A nara nwaanyị a ụmụ ya ma ha bịakọrịtara ọnụ ọzọ n'afọ 2014. Ha lụrụ onwe ha oge anabatara n'iwu nwaanyị ịlụ nwanyị maọbụ nwoke ịlụ nwoke ibe ya na mpaghara ahụ. Ndị nyocha chọpụtara na Patricia Ann Spann lụburu nwa ya nwoke mgbe nke ahụ dị afọ iri na asatọ, ebe nwata nwoke agbụ bibiri njikọ ahụ n'afọ 2010. Akụkọ ga-amasị gị: Onye bụbu ụkọchụkwụ Katolic agbala akwụkwọ 'Ndị ụlọ anyị sị m ma alọtazina ụlọ ọzọ ma m ahụghị di' Nwa Dangote agbala akwụkwọ na Kanọ Ọ bụ ngalaba na-ahụ maka nleta chọpụtara maka nwaanyị ahụ na nwa ya oge ha jere nleta n'ụlọ ha. Dịka akwụkwọ akụkọ siri kwuo, Misty Spann bibiri njikọ ya na nne ya n'ọnwa Ọctoba afọ gara aga ka nwechara ndọrịta ụka na nne ya jịrị aghụghọ duba ya na njikọ ahụ. Misty Spann kwuru na nne ya tụrụ ya asị na ya na "ọkaiwu atọ kpara ndị nyere ya ndụmọdụ ya ga n'ihu na nsọgbụ adịghị na njịkọ ahụ". Patricia Ann Spann kwuru na ya kwenyere na njikọ ha emegideghị iwu n'ihi na edebaghị aha ya n'akwụkwọ ọmụmụ nwa ya nwaanyị dịka nne mụrụ ya ebe ha zutere onwe ha afọ abụọ tupu ha ejikọ aka. Misty Spann kwetara na ya mebiri iwu megidere mmekọrịta ndị bụ ọbara. E nyere ya afọ iri maka nyocha na nleta na aka ọchamara ihe gbasara akọ na uche. Ebe nne ya bụ Patricia ga-atukwasị nyocha afọ asatọ n'elu mkpọrọ a tụrụ ya. A ga tinyekwa aha ya n'akwụkwụ dịka onye metọrọ mmadụ ma ọ pụta na nga. N' iwu dị na mpaghara Oklahoma, mmadụ ịlụ ọbara ya bụ mmetọ ọbara ma ha enwere maọbụ na ha enweghị mmekọrịta ahụ ọbụla.
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43446709
Egbuola ndị ọkụ azụ na Lake Chad
Mmadụ ise a egburu bụ ndị asị na ha na-enyere ndi agha Naịjirịa aka ịchọ ụmụakwụkwọ ndi Boko Haram tọọro.
2018-03-18T06:03:22Z
'Ndị Boko Haram egbuola ndị ọkụ azụ 5 na Lake Chad
Ndị agha Chad Ndị agha si Chad, Naịjirịa na Cameroon na-ebuso ndị Boko Haram agha Akụkọ na pụta site ụwụwa anyanwụ ugwu Naịjirịa na ekwu na ndị omokome a na-eche na ha bu ndị Boko Haram egbuola mmadụ ise bụ ndị na-akụ azụ na Lake Chad. Ihe a mere na ime obodo dị na Lake Chad. Ntọrọ Dapchi: Ewepụtala Kọmitii nyocha Ndị mụrụ ụmụakwụkwọ Dapchi wuchiri Abuja Mwakpo Dapchi: Ụmụakwụkwọ 110 na-efu Onyendu ndị na-akọ azu na Borno Steeti bụ Abubakar Gamandi siri na egburu ndị a maka ha na enyere ndị agha Naịjiria aka n'ịchọ ụmụakwụkwọ a nwụchịrị na Dapchi na ọnwa gara aga. Mwakpo a ejiri gbuo ndị a mere na ala miri gara okirikiri a na-akpọ Tudun Umbrella n'ime Lake Chad, bụ ebe Naịjirịa, Chad na Cameroon nwere ụsọ. Onyesisala Naịjirịa bụ Muhammadụ Buhari sị na ya na-agba oke mbọ ka a hụ na ụmụakwụkwọ a ndị Boko Haram tọọrọ laghachitere. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Stephen Hawking anwụọla n'afọ 76 NotTooYoungToRun emeela ngaghari iwe n'Abuja Buhari agbaala Idris ajụjụ maka nnupuisi
[ "Boko Haram", "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Chad" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43455132
Ihe ị na-amaghị maka ụkwa ị na-eri
Ụkwa bụ otu nri a na-ejighị egwu egwu n’ala Igbo, ọ bụkwa otu njirimara ndị Igbo.
2018-03-19T13:00:33Z
Nri ndị Igbo: Ihe ị na-amaghị maka ụkwa ị na-eri
Ụkwa A na-ahapụ ụkwa ka o ree ure tupu ewere mkpụrụ ya Ọtụtụ ndị Igbo ma ụkwa ma na ha amaghị etu esi emepụta ụkwa tupu ọ bụrụ ihe a na-eri eri. Ụkwa nwere osisi nke na-amịpụta mkpụrụ ụyọkọ buru ibu nke Bekee na-akpọ 'breadfruit'. Azụ mkpụrụ ụyọkọ ya na-acha akwụkwọndụ akwụkwọndụ, ebe mkpụrụ mkpụrụ dị ya n'ime na-emepụta ihe anyị na-akpọ ụkwa. Ụyọkọ ụkwa chaa, o si n'elu osisi ya daa n'ala, a hapụ ya ka ọ ree ure tupu a kụwaa ya ma wepụta ụkwa nke a na-esi esi. Ya mere ndị Igbo ji asị na 'ụkwa ruo oge ya ọ daa'. Tupu e rie ụkwa, ọ ga-agabiga ụzọ dị icheiche dịka: Isi ya esi Ighe ya eghe Maọbụ ịhụ ya n'ọkụ Ngwa nri eji esi ya Ose Nnu Ụkwa Mmanụ nri Ụfọdụ na-etinyekwa yabasị, maggị nakwa ịsha Ụfọdụ na-etinye azụ ọkpọọ ebe ụfọdụ na-etinye akwụkwọ nri Ụfọdụ na-etinyekwa mkpụrụ ọka Ụfọdụ na-etinyekwa ogiri "Ụkwa ruo oge ya ọ daa" Etu esi esi ya Ihe ndị a ka ị ga-eme tupu isie ụkwa gị: Saa ụkwa gị mmiri ọfụma iji hụ na aja maọbụ kịrịkịrị okwute adịghị ya n'ime. Wunye ya n'ime ite tụmadụ nke bekee kpọrọ 'pressure pot' ma wunyekwa ya mmiri ga-ekpuchi ya ọfụma Ụfọdụ na-etinye akanwụ maọbụ ngọ iji mee ka o dee ma ghee ọsịsọ O ghewe nakwa mmiri dị n'ime ya tawa, tinye ya ose akwọrọ akwọ, mmanụ nri na nnu Hapụ ya ka ya na ngwa nri ndị ị tinyere n'ime ya sụkọta ọnụ Kpagharịa ya ma hapụzịa ya ka ọ nọrọ n'ọkụ dee ede ma ghee ọfụma Ụkwa bụ otu nri nwere ụtọ nke ya ị ga-erinwu ma ị tinyere maọbụ itinyeghị ngwanri ọbụla Etu esi eri ya A bịa n'ụfọdụ obodo dịka Urualla dị n'Imo steeti, ha anaghị azapụ mmiri e ji sie ụkwa ha. Ha na-aṅụ mmiri ya iche ma riekwa ụkwa ha iche. Ụfọdụ anaghị etinye mmanụ nri n'ime n'ụkwa ha, ebe ụfọdụ na-ahapụ mmiri ụkwa n'ime ya nke bụ na ha kuru ya ha ekuru ya na mmiri. A na-eghekwa mkpụrụ ụkwa eghe, jiri akị etiri eti maọbụ akị bekee taa ya. Ọtụtụ ndị mmadụ na-eji ụkwa eghere eghe atagharị ọnụ Etu esi echekwa ụkwa A na-agba ụkwa n'anwụ ka ọ kpọọ tupu a gbaa ya n'akpa maka ndị ga-azụta ya iji aga ala bekee. Tupu ị sie nke kpọrọ akpọ, banye ya na mmiri site n'abalị ruo mgbe chi foro n'ụtụtụ. Nke a ga-eme ka o nwee ike dee ọfụma ma ghee ọsịsọ mgbe ị ga-esi ya. Ihe ọ na-enye n'ahụ Nchọpụta ndị ọkachamara sayensị chọpụtara gosiri na ụkwa nwere ọtụtụ ihe ndị dị mma n'ahụ, dịka riboflavin, iron, niacin, thiamin, iron na fosforụs. O nwekwara potassịọm, kọpa, iron, magnizịọm, kalshịọm, zịnkị, manganeezi, selenịụm nakwa fosforụs na vitamin C. Ọ dị mma maka mkpụrụ obi mmadụ. Ụfọdụ na-eji akwụkwọ osisi ya asacha isi maka ọ na-egbu igu isi nke bekee kpọrọ dandruff, na-akwụsịkwa ndapụsị ntutu. O nwekwara obere abụba kpụkọrọ ọnụ nke bekee kpọrọ saturated fats, kọlesterọl nakwa sodịọm. Ụfọdụ na-aṅụ mmiri ụkwa iche ebe ụfọdụ na-eri ya na mmiri ya Ihe ndị ọzọ eji ya eme ị na-amaghị A na-etinye ụkwa n'ime ụfọdụ mmanụ na-aba n'anya iji nye ya ụtọ (flavour) A na-akwọ mkpụrụ ụkwa akwọ jiri ya mee ihe bekee kpọrọ flour A na-apịpụtakwa ya mmanụ Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọ na-akpotu n'Enugwu maka nleta Fayose mere ebe ahụ Anyị ga-akpụpụ gọọmentị n'ụlọ ịkpe - ICSC Uru ọmụgwọ bara n'omenala Igbo
[]
https://www.bbc.com/igbo/media-43462783
Gịnị ka gọọmentị ga-eme maka ikpofu ahịhịa?
Onye bibu nsọ ebe a na-ekpofu ahịhịa na otu dọkịta kwuru na ụdị ebe ahụ na-amụpụta ọrịa dị iche iche.
2018-03-19T18:18:52Z
Anwụlụ na oke isi achụọla ndị mmadụ ọsọ
Ebe ha na-etufu ahịhịa Awụlụ si ebe a ana-etufu ahịhịa na-ebute nnukwu ọrịa Ndị bịrị na mpaghara Ikosi, Isheri ma ọ bụ Ketu na Lagos steetị na-aṅụ ajọ ịsị si n'ebe ndị gọọmentị na-aga itufu ahịhịa a kpọrọ Olososun dumpsite n'Ojota. Enugu Steeti nwere nke a ha n'okpokoro ụzọ awara awara si Enugwu ga Port Harcourt. Ajọ isi n'apụta n'ebe ndị a ka nkụ nke nke na Lagos, ụfọdụ ndị bị n'ebe a akwapugo n'ihi oke isi. Na Lagos, akụkọ kwuru na otu nwata nwụrụ makana onweghị ike iku ume n'ihi na anwụlụ sị ebe a juputara ebe niile. Maka ihe a, Gọvanọ Lagos bụ Akinwunmi Ambode emechiela ebe a ana-atufu ahịhịa. Gọọmentị na ndị obodo na-agba ebe ahịhịa okụ oge ọbụla Ihe ndị mmadụ na-ekwu Mana oke isi ahụ ka dịkwa nakwa ndị mmadụ biri na-ebe a. BBC Igbo kpọrọ otu nwoke akpọrọ Samuel Osaze bị bụ ebe a n'elu ekwentị. O kwuru na awụlụ na-esi ebe a na-apụta bụ ihe na-bute nnukwu ọrịa. "Awụlụ a na-apụta makana gọọmentị na-agba ebe a ọkụ oge ọbụla. Ụnyahụ mgbe m nsị okporo ụzọ ịkọsị na-aga be m, nnukwu awụlụ juputara ebe niile n'ebe ahịhịa a" N'afọ 2013 otu na-ahu maka ịtufu ahịhịa na Lagos bụ Lagos Waste Management Agency LAWMA kwuru na ahịhịa Lagos ruru tonnes puku iri na atọ Otu dibia bekee, Dkta Ikechukwu Mgbolu kwuru na anwụlụ si ebe a na-etufu ahịhịa na-ebute ọrịa dị iche iche dịka ọnyụnyụ na ọgbụgbọ (Cholera), Taifọd, ịba(malaria) na lasa fiva. O kwukwara na ndị nwere ọrịa ashịma(asthma) anaghị enwe ike ibi nso ụdị ebe a. Mgbolu kwuru:"Nnukwu anwụrụ a na-ebụte ọrịa ngụgụ elu nke a kpọrọ 'upper respiratory infection' na bekee nihi ajọ ikuku kabọn monozide dị n'ime anwụlụ." Osaze kwuru na isi a a na-ekweghizi edi n'etiti ọnwa Maachị na Ọgụsụtụ afọ niile maka oge a bụ oge udummiri. Ndị biri na Lagos na-etufu ahịhịa oge ọbụla n'okporo ụzọ na Lagos Osaze kwuru, "Onweghị obodo ndị mepere anya na-agba ebe a na-etufu ahịhịa ọkụ ugbua makana ha mara na omume dị otu a na-ebute nnukwu orịa. "Gọọmentị kwesịrị ịzụ ihe a akpọrọ incinerator na bekee bụ igwe eji agba ahịhịa ọkụ." Gọvanọ Ambode ekwuola na agaghị na-atụfu ahịhịa ọbụla ebe ahụ ọzọ maka ọrịa di iche iche ọ na-ebuta. Ọ dị zị ndị steetị ndị ọzọ n'aka ikwu ihe ha ga-eme ebe ntufu ahịhịa dị n'etiti obodo ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe Buhari ji kagbuo njem Rwanda Ndị ụlọakụ a na-ezu ụmụ Naịjirịa ohi?
[ "Legọsị", "Naijiria", "Ahụike", "Akụ na ụba", "Legọsị steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43460322
Ugbọala Uber na-akwọ onwe ya gburu mmadụ
Otu ụgbọala Uber na-anya onwe ya kụgbulu otu nwaanyị na obodo Tempe dị na Arizona, na mba Amerika
2018-03-20T05:56:39Z
Ugbọala Uber na-akwọ onwe ya gburu mmadụ na Amerịka
Uber Ụlọọrụ Uber egosila obi mwute maka nwaanyị ụgboala ha gburu Uber bụ ndị so na emepụta ugbọala na anya onwe ya ekwuola na ha akwụsila ntule ụgbọ na-anya onwe ya ka otu ụgbọala ha kụgbụrụ otu nwaanyị dị afọ 49 na-agbafe okporoụzọ n'obodo Tempe dị na Arizona. Dịka akụkọ si were kwuo, ihe ọdachị a mere ka ụlọọrụ Uber kwụsị ntule ụgbọ na-anya onwe ya ahụ ha bidoro. Onyeisi Uber bụ Dara Khosrowshahi kwuru na Twitter na ọnwụ ahụ bụ ihe 'oke obi mgbawa". "Anyị na-eche maka ezinaụlọ ọ dachi metụtara ma anyị na ndị ụweọjịị na-arụkọrịta iji ghọta ka ihe siri mee." Ihe mberede a abụghị sọ sọ Uber ka o metụtara, ọ ga emetụta mbọ a na-agba iji rụpụta ụgbọala na-agba onwe ya maka njem ọra mmadụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Anyị ga-akpụpụ gọọmentị n'ụlọ ịkpe - ICSC Ndị ụlọakụ a na-ezu ụmụ Naịjirịa ohi? Putin ga-achị Rọshịa afọ isii ọzọ
[ "Amerika", "Njem" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43468717
'Ọ nara m ngwa ọrụ m n'ike'
Ndị ọrụ gọọmenti Lagos Steeti wakporo onyentaakụkọ BBC ma narakwa ya ngwa ọrụ ya n'ike.
2018-03-20T10:42:34Z
Ndị ọrụ gọọmentị Lagos Steeti awakpola onye ntaakụkọ BBC
Ụgbọala na-agafee Ndị ọrụ gọọmentị a nara onye ọrụ BBC ngwa ọrụ ya n'ike Ndị na ahụ maka gburugburu na Lagos Steeti bụ Lagos State Minsitry of Environment naraala onye nataakụkọ British Broadcasting Corporation (BBC) ngwa ọrụ ya wee wepụ ihe niile osetere ma were ya bụ ngwa ọrụ gbalaga. Ndị ngalaba gọọmentị a bịara ebe ndị na-arụzị ugbọala na anọ, bụ nke dịnyara ebe a na-awaufu aghighịa nke a na-akpọ Olushosun, ịgbachị ya. Gọọmentị Lagos Steetị kpebiri na-aga agbachị mpaghara Olushosun maka ọkụ na-agba n'ime ebe a na-ekpopu aghighịa kemgbe izuụka gara aga. O ka ha bịara ọrụ ka ha narịrị onye ntaakụkọ BBC bụ Joshua Ajayi ngwa ọrụ ya. Maazi Ajayi nọ na-agba ndị mgbachị a metụtara mgbe ndị ọrụ gọọmentị wakporo ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị: Ugbọala Uber na-akwọ onwe ya gburu mmadụ Gịnị ka gọọmentị ga-eme maka ikpofu ahịhịa? Onye du ndị a bụ Awoniyi Joshua, bu osote onyeisi na ngalaba gọọmetị Lagos ahụ. Maazị Joshua nyere ndị ọru ya ikike ha gbachie ebe ahu ndị na-arụ ụgbọala na-anọ, agbanyeghị na ndị mmadụ na arịọ ka ha bụpụ ụgbọala andị mmadu nọ na ime ebe ahụ. Otutu n'ime ndị ọrụ ụgbọala na-agba mbọ ịbụpụ ụgbọala dị n'ime ebe ahụ. BBC ebidola mbasa ozi na asụsụ anọ na Naịjirịa Emechara nyeghachị onye BBC ngwaọrụ ya na mgbede, mana ọ mgbe onye ndụmọdụ onyenachị Lagos steetị maka mgbasa ozi bụ Idowu Ajanaku tinyere ọnu n'okwu. Onye ode akwụkwọ Lagos Steeti bụ Abiodun Bamgboye, ka ọ na eme ka ọgbachịtere gọọmentị ọnu maka ihe ndị ọrụ ha mere, rịọ ndị ntaakụkọ ka ha kpachara anya ha ma ha na-etinye ọnụ n'okwu dị otua, maka onwere ike bute ọgbaghara, okachasị ugbua election na-abịa nso. Mana o kwọwanughị ihe mere eji nara onye Ajayi ngwaọru ya, ka ọbụ etu ha siri mepe ya wee wepu ihe onyonyo na foto dị n'ime ya. Tupu okwuo okwu a, onye bụ osote akana-achị ndi a na arụ ọgbọala bụ Olaniyi Adeoti gwara BBC na ndi otu ha na ndị gọọmentị a nwere nzụkọ n'otu elekere tupu ha abịa ịgbachi ebe a ha na arụ ọlụ. "Ebe ka anyi na enweta ihe anyi ji eri nri, kedụ ebe ha chọro ka anyị ga? Gọọmentị a kwere anyi nkwa mgbanwe, mana ọ afụfụ ka anyi na ahụ. "Ha na ata anyị ahụhụ, ha kwesiri inye anyi ohere ibupu ugboala dị n'ebe a. Ebe a na-arụ ụgbọala ruru 45," O kwuru mgbe ọ kpọrọ BBC gagharịa ebe a na-arụ ọrụ. Maazi Adeoti, ka ndị ọzọ nọ ebe ahụ si na ụlọọrụ ha ama nwe nchekwa ma gọọmentị mechie ebe ahụ. Onye ọzọ na ebe ahụ achoghi ka akpọ aha ha sịrị na nsogbu ha sitere n'aka ndọrọndọro ndị ngalaba gọọmenti Lagos aka ha dị na gbụrụgbụrụ na ọrụ ụgbọala. Otu onye anya hụru ihe mere kwuru na mmechị a aka na-achị Lagos Steetị bu Akinwunmi Ambode nyere iwu ya bụ nke ebe a na-atupu aghighia na Olushosun ogbughi ebe ndi mechanic na arụ ọrụ. Ndi ụlo ha di na gbụrụgbụrụ Olushosun na enwe ezigbote nsogbu ahuike make aṅụrụ na-akwa ha kemgbe ọku bara abe ahu na izuụka gara aga. Ugbua, ndi bi ebe ahu ji akwa eketchi ime ha. Na Friday, Ambode sịrị na ihe ha jiri mechie Olushosun bụ maka ebe ahu abughị ebe mmadu kwesiri ịnọ.
[ "Legọsị", "Naijiria", "ọrụ ndị nta akụkọ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43468987
Kpọghachite ndị uweojii - Ibrahim Idris
Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris kwuru na nke a ga-eme ka ndị uweojii nwee ike ịrụ ọrụ dịrị ha.
2018-03-20T12:43:58Z
Idris ekwuola sị kpọghachite ndị uweojii na-eche ndị nkịtị
Ibrahim Idris Ibrahim Idris bidoro ịchị ndị uweojii Naịjirịa n'afọ 2016 Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim Idris enyela iwu ka akpọghachị ndị uweojii niile na-eche ndị nnukwu mmadụ, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị ọcha nọ na Naịjirịa nche. Idris kwuru na ọ ga-edegara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari, akwụkwọ iji nweta nkwado ya, nke a ga-eji mere ntuziaka eji edupu onye uweojii ozi nchekwa ndị nnukwu mmadụ. O kwuru nke a na nzukọ ya na ndị Kọmishọna ndị uweojii na ndị uweojii ndị ọzọ ọkwa ha gbalitere, nwere n'isi ụlọọrụ ha n'Abuja ụnyaahụ. Idris kwuru na iji hụ na ndị mmadụ mere ihe o kwuru, na etinyela ihe bekee kpọrọ task force nke Adamu Dankwara bụ osote kọmishọna ndị uweojii bụ onyeisi ya. O kwukwara na o nyere iwu ka ndị uweojii bido ime ihe a n'etufughị oge ọbụla. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mwakpo Dapchi: Ụmụakwụkwọ 110 na-efu Ntọrọ Dapchi: Ewepụtala Kọmitii nyocha Ndị mụrụ ụmụakwụkwọ Dapchi wuchiri Abuja Idris kwuru sị "Maka nsogbu anyị na-enwe na Naịjirịa gbasara nchekwa, ọ dịla ezigbo mkpa ka ndị uweojii Naịjirịa wetuo aka n'etu ha si ezipu ndị otu ha n'aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị nnukwu mmadụ. "Maka nke a, m ga-edegara onyeisiala akwụkwọ iji nweta nkwado ya nke a ga-eji mere ntuziaka eji edupu onye uweojii ozi nchekwa ndị nnukwu mmadụ nọ n'ime mba a. Etu ahụ, enyela m iwu ka akpọghachite ndị uweojii niile ezipuru ka ha na-echekwa ndị nnukwu mmadụ, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị na-arụ n'ụlọọrụ ọha."
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43482313
Abia steeti ewetaala ụzọ ahụike ọhụrụ
Aka na-achị abia bụ Okezie Ikpeazụ kwuru na ụzọahụike a bụ maka atụmadụ ndị nọ nime obodo.
2018-03-21T07:00:53Z
Abia steeti ewetaala ụzọ ahụike ọgbara ọhụrụ
Okezie Ikpeazụ Ikpeazu na-akwalite akụkụ dị ichecihe iji wulie steeti ya Gọọmenti Abia steeti akwenyela ka e bido ụzọ ọhụrụ iji nye ahụike na steeti ahụ nke a kpọrọ "telemedicine" na bekee. Telemedicine bụ atụmatụ ọhụrụ ebe dọkịnta na ndị ọrịa nwere ike ịkparịtaụka site n'ekwentị ọkachasị n'oge ihe mberede. A na-ele anya n'ụzọ a ga-enye aka ịzọ ọtụtụ ndị mmadụ ndụ n'ọge mberede 'Ihe mere anyị jiri kwụsị Jọstis Ụzọkwe ọrụ' Gọọmenti etiti na-atụ asị-Nwunye Kanu Ipob asaala Gọvanọ Ikpeazu Dịka ndị ọrụ ahụike kọị̀ara ya, ha kwuru na telemedicine bụ ezi ụzọ onye dọkịnta na ọnye ọ na-eleta nwere ike ịkpakọrịta nkeọma. Dọkịnta ahụ na ọnye ọ na-eleta ga-eji ekwentị amapụtara wee na-akparịta ụka ee ekwentị ahụ na-aga n'isi ebe ndị dọkịnta ọpụrụiche nọ. E kwuru n'ụzọ a na-aga nkeọma na mba ofesi. Oge a kọwachara Ikpeazu etu o si arụ ọrụ, ọ nwalekwara ya ma kwee n'isi na ọ gara nkeọma tụpụ o weliere ya aka elu ịụ̀a n'ihu. Onye na-ahụ maka ọrụ a bụ Dọkịnta Omas Ubaime gwara Ikpeazụ na Abịa steeti bụ steeti mbụ ebe a na-anwale igwe na Naịjirịa niile. Ubaime kwuru na ha tụrụ anya inweta oku mmadụ puku abụọ mana ha nwetara mmadụ puku itoolu ndị ọrịa nek gosiri na ịhe nchọpụta a ga-aga nkeọma. Ọ kọwara na ha ga-enye ndị mmadụ kaadị pụrụiche ga-ebu akara piini a ga-ere n'ọnụegọ narị ise. Kaadị ka oney ọịa ga-eji kpọọ ma nye onye dọkịnta piini ya. Ubaime kwuru na ha na ndị ụlọọgwụ ndị na-ahụ maka ahụike ga-arụkọ ọrụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọtụtụ mmadụ agbaala ọsọndụ na Kogi Akụkọ kachasi taa: Ihe na-ewe ụmunwaanyị na Toni Kan iwe NotTooYoungToRun emeela ngaghari iwe n'Abuja
[ "Naijiria", "Abia Steeti", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-43476026
'A chọrọ m ịbụ onye ọka iwu'
BBC Igbo gara ileta ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ n'Ikoyi Lagos ebe ha lere ule UTME ma jụta kwa ha ihe bụ ọdịnihu ha.
2018-03-21T19:57:03Z
Ndị ụlọ mkpọrọ eleela ule nke a kpọrọ UTME iji banye Mahadum
Akụkọ ga-amasị gị: Ọrụ si n'aka: Jessica Nwankwo
[ "Nga", "Ọmụmụ na mmụta", "West Africa", "Afịrịka", "Ikpe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43497298
Ekweremadu 'zoro akụnaụba ya'
Gọọmenti etiti ebola osote onyeisi ndị Sineti bụ Ike Ekweremadu ebubo na ọ tụrụ asị n'ikwuputa akụnaụba ya.
2018-03-22T12:30:39Z
Ike Ekweremadu 'tụrụ asị ma zo akụnaụba ya'
Ike Ekweremmadụ Ike Ekweremmadụ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na mahadu Naịjirịa dị n'Enugu Gọọmenti etiti akpọpụla osote onyeisi ndị Sineti bụ Ike Ekweremadu n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ka akpachie ụfọdụ ụlọ ndị o nwere na Naịjirịa na mba ndị ọzọ. Ha kwuru na ọ tụrụ asị n'ikwupụta akụnaụba o nwere nye ndị ụlọọrụ Code of Conduct tupu o were oche ọchịchị N'ime ụlọ ndị a, itoolu dị na Naịjirịa, asatọ dị na Dubaị, atọ dị na Flọrịda, ebe abụọ dị na Lọndọn. Ekweremadu: Ike agwụla ndị ụlọ ome iwu Saraki ga-alaghachị n'ụlọ ikpe Onyeisi otu nyocha na iweghachi akụnaụba Naijiria nke onyeisiala hiwere bụ Okoi Obono-Obla kwuru na Ekweremadu ekwupụtaghị akụ ya niile n'ime akwụkwọ nkwupụta odere n'ọnwa Juunu nke afọ 2007 nakwa 2015. Ndị otu a site n'ọnụ ọkaiwu Festus Keyamo gwara ụlọikpe na-enyocha Ekweremadu maka ị da iwu ndị Code of coduct nyere ndị nọ n'ọchịchị. Akwụkọ ha degara ụlọikpe kwuru ka-akpachie ụlọ ndị ahụ Ekweremadu nwere rue mgbe ha ga-emecha nyọcha banyere ya. 'Ebubo ndọrọndọrọ ọchịchị' Ekweremadu site n'ọnụ onye ndụmaọdụ ya na mgbasa ozi bụ Uche Anichukwu kwuru na okwuputala akụnaụba ya niile nye ndị ụlọọrụ Code of Conduct dịka e dere n'iwu. "Ndị nyocha a jụrụ maka akwụkwọ nkwuputa bụkwanụ nke enyere haa ma ha achọghị ileba ya anya, maka ọ bụ ihe ndọrọndọrọ ọchịọchị nke 2019. Sịnetọ agwala ndị ọkaiwu maka nke a, ha ga-ezute ndị a n'ụlọikpe." Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ego ole ka ndị ụlọikpe na-eri? Mikel agaghị eso sọọ mpi na Poland Mbọ ndị BBC gbara iji nweta ndị otu Ekweremadu na ndị ụlọọrụ Code of conduct enweghị isi, dịka ha azaghị ekwentị ha. Cheta na onyeisi ndị Sịneti bụ Bukola Saraki ka na-azara ọnụ ya ugbua gbasara otu ebubo nkwuputa akụnaụba ahụ. Nke pụtara na ndị isi ọchịchị Sịneti abụọ nọ n'ime ọgbaghara nkwuputa akụnaụba ha.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Mpụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43519237
Mba Spain ejidela otu Naịjirịa na-arụ ọrụ akwụna
Akụkọ na-akọwa na ụmụnwaanyị ahu esi n'aka ndị otu ahụ tọghapụ bi n'ebe ekwesịghị ka anụmanụ nọrọ na ya.
2018-03-23T16:54:18Z
Ndị uweojii na Spain anwụchiela otu na-azụ ohu akwụna
Ndị oji na -arụ ọrụ abalị na mba Yuropụ dị icheiche Ndị uweoji na mba Spain a tọghapụ la ụmụnwaanyị ruru iri atọ n'itoolu esi na Naịjiria bubata na Spain ị rụ ọrụ akwụna. Ọtụtụ n'ime ụmụnwaanyị a ndị emere ntọghapụ bụ ụmụaka anwụchịrị n'ike na Naịjịrịa ma tinye kwa ha n'ọrụ ahụ n'ike. Europol bụ otụ ndị uweoji nke mba Europe ekwuola na ha chọtara ụmụnwaanyị a ebe ha bi n'ime ọgba ebe otu ahụ jichiri ha. Ha sị kwa na otu ahụ ama ama tinyere ụmụnwaanyị ahụ n'ọrụ maka ị kwụghachị ụgwọ ruru nde euro iri atọ ha boro ụmụnwaanyị ahụ. Mmadụ ruru iri asato n'itoolu ka anwụchiri n'okwu a, n'ime ha bu onye egwu Naịjiria ama ama mana enyebeghị aha ya. Ejichiri ya ebe ọ sị Spain a laghachi Naịjiria mgbe ọ rụchara ihe onyonyo egwu ya. Akụkọ ga-amasị gị: China na Amerika na-ama aka n'ihu Onye jichiri ndị mmadụ anwụọla na France Bill Gate ekwutechaghị ya-Ọkamụta
[ "Europe", "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43531058
Ndịagha asaala TY Danjuma
Ndịagha Naịjirịa kwuru na ha agaghị asa TY Danjuma okwu, mana ha gọrọ na ha na ndị ọchịehi enweghị mmekọ.
2018-03-25T09:15:10Z
Ndịagha asaala TY Danjuma maka ndị ọchiehi
T Y Danjuma N'afọ 1976, T Y Danjuma bụ onyeisi ndịagha Naịjirịa Onye bụbụ onyeisi ndịagha Naịjirịa, ma rụkwa ọrụ ka Minista na-ahụ maka nchekwa obodo nke bekee kpọrọ 'Minister of Defence' n'okpuru Olusegun Obasanjo bụ onyeisiagha TY Danjuma, kwuru okwu dara ụda ụnyaahụ ka ọ nọ n'emume iji sị ndị gụchara akwụkwọ daalụ nke e mere na mahadu, Taraba steeti dị n'isi obodo Taraba bụ Jalingo. Danjuma sị ka ndị Naịjirịa chekwaa onwe ha maka na ndịagha Naịjirịa na ndị omekome na-egbu mmadụ n'ebe dị icheiche na-arụkọ. Onye na-achị Ebonyi amachiela ọchị ehi Egbuola ndịagha Naịjirịa abụọ na Plateau Egbuola ndịagha Naịjirịa abụọ na Plateau Ka okwu a yabụ okenye kwuru ka na-erugharị, ndịagha Naịjirịa tinyere ọnụ na ya, wee sị: "Anyi nụrụ ihe okenye a a na-asọpụrụ kwuru, mana anyị achọghị ịsa ya okwu. Mana, onwere ebe anyị chọrọ ido ndị be anyị anya. "Ọ bụ ndịagha Naịjirịa ka e nyere ikike ịchekwa Naịjirịa ma nyekwa ndị nkịtị aka ma-agwa ha mee etu a. Maka nke a, ehibere atụmatụ nchekwa anyị kpọrọ 'Ọsọ buusu' n'usoro iwu na-achị Naịjirịa. "Ya mere eji zipu ndịagha ka ha gaa gbochie ike ndị ọchiehi na-akpa n'etiti Naịjirịa, na ebe ndị ọzọ. Kemgbe ebidoro "Ọsọ buusu", gọọmentị Taraba akwadoghị atụmatụ a, maọbụ nyere ndịagha aka etu okwesịrị. "N'agbanyeghị agwa a, ndịagha Naịjirịa akwụsịghị ọrụ nchekwa ha na Taraba, nke butere ogbugbu e gburu otu n'ime ha n'ụbọchị 16 nke ọnwa Maachị n'afọ a." Ozi a ndịagha Naijiria zipuru gakwara n'ihu na-asị ka ndị Taraba nakwa ndị Naịjirịa niile na-aga n'ihu na-eme ihe ha na-eme ka o kwesịrị. BBC Igbo gbara mbọ inụta n'ọnụ onye na-ekwuchitere gọvanọ Taraba Steetị nakwa onye na-ekwuchitere onyeisiala bụ Garba Shehu mana ha azaghị ekwenti ha. Anyị ga-ewetere unu ozi ma anyị nweta ya. Akụkọ ga-amasị gị: France: Otu onye uweojii anwụọla Ndị obodo Dapchi alaghachịta la IGR: Ego Anambra, Akwa-Ibom agbadala
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Taraba steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-43552585
Mba 20 esonyela ịchụpụ ndị Rọshịa
Mba Ọstrelia esonyela mba ruru ọnụ ọgụgụ 20 na-achụpụ ndị mba Rọshịa nọ n'obodo ha maka onye e nyere nsị.
2018-03-27T06:25:32Z
Mba 20 esonyela ịchụpụ ndị Rọshịa
Malcom Turnbull Onyeisi mba Ọstrelia bụ Turnbull kwuru na agwa a bụ maka ihe ndị Rọshịa mere Mba Ọstrelia abụrụla mba ọhụrụ so achụpụ ndị mba Rọshịa nọ na mba ha arụ ọrụ dịka ndị nyocha nzuzo iji kwado mba UK maka nsị e nyere onye bubu onye nyocha nzuzo nke Rọshịa nọ na UK. Onyeisi mba Ọstrelia bụ Malcolm Turnbull kwuru na nsị ahụ e nyere na Salisbury bụ agha e busoro mba niile. Ihe karịrị ndị ọrụ Rọshịa mmadụ 100 ka-achụpụrụ site na mba dị icheiche na US na Eu ụnyaahụ. Mba Rọshịa ekwela nkwa na ha ga-azaghachi mba ndị niile chụpụrụ ndị ha etu ha si mee ha. Russia ga-achụ ndị ọrụ UK mmadụ 23 Putin ga-achị Rọshịa afọ isii ọzọ Rọshịa agọnarịala na aka ha dị na nsị ahụ e nyere Sergei Skripa na nwa ya nwaanyị, Yulia na Salisbury dị mpaghara ọdịda mba Ịngịland. Ndị nyocha kwuru na nsị ahụ e nyere ha bụ ngwọagha ndị agha dịka mmadụ abụọ ahụ ka nọ n'ajọ ọnọdụ n'ụlọọgwụ. Ọstrelia na-achụpụ mmadụ abụọ bụ ndị nyocha nzuzo a na-amaghị maka ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mmadụ anọ chọrọ ịna Buhari ọkwa ya Kedụ isi ụka Naijiria na Boko Haram? 'Achọghị m ị na-echekwube nwoke inye m ego'
[ "Europe", "United Kingdom", "Rọshia", "Amerika", "Ọgbakọ nke Europe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43565645
Atiku etinyela ụkwụ na ndọrọndọrọ 2019
Ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 enwetela onye ọzọ dịka Atiku Abubakar kwuru na ya ga apụta na okpuru PDP.
2018-03-28T07:10:50Z
Ntuliaka 2019: Atiku Abubakar chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala
Atiku Abubakar Atiku so na ndị gwuzobere APC Onye bụbụ osote onyeisiala Naijirịa bu Atiku Abubakar ekwupụtala na ya ga-eso zọọ ọchịchị ka onyeisiala n'afọ 2019. Atiku bụrụ osote Olusegun Obasanjo mgbe o rịrị oche ọchịchị site 1999 ruo 2007 kwuru nke a na Portharcout ụnyaahụ dịka ọ kwuru na ya ga-azọ ọchịchị ahụ n'okpuru pati PDP. Atiku na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na PDP gara Rivers Steeti ka ha na ndị isi PDP na steeti ahụ nwe mkpakọrịta. 2019: 'Ndị Igbo akwadoghị Buhari' Ọtụghị ndị mmadụ n'anya na Atịkụ kwụpụtara ebụmobi ya banyere ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 maka na a na-anụbụ kepukepu ya kemgbe ọ hapụrụ APC laghachi PDP n'afọ 2017. Atiku n'onwe ya kwuru na ya na-enwepụta onwe ya ka onye ga-etinye Naịjirịa n'ụzọ ọhụrụ site n'ihe o kwuru bụ "ọdịda nnụkwụ APC". Atiku kwuru na kemgbe 2015, gọọmentị APC mebiri akwụkwọ ahụike na ọrụ ndozi obodo site na-anaghị etinye ego na ha etu okwesiri. "Kemgbe 2015, onwebeghi ụzọ ruru kilometre 100 gọọmenti APC rụrụ ebe ọbụla n'ala anyi," Atiku sịrị. Onwerike ọbụrụ Buhari na ga-anọ n'isi ndị ndọrọndọro ọchichị nke 2019 Ọ tụkwala aka na ya na-eche na APC ayasala udo na ịdịnaotu nke ndị Naịjirịa nwere. "Ahụbeghị m ka ndị Naịjirịa si otua kewa n'atụmatụ okwukwe, asụsụ nakwa ebe e si. Nkewa a sitere n'aka APC na etu ha si chịbie," Atiku kwuru. Ndị APC asabeghị ya okwu a mgbe BBC Igbo dechara akụko a. Okwu Rochas banyere ọchịchị Buhari Mana, Atiku bụ onye mbụ pụtara kwuo na ya ga-azọ ọchịchị ka onyeisiala na atụmatụ pati abụọ aha ha na-ada ụda na Naịjirịa bụ PDP na APC. Agbanyeghị na ndị mmadụ na-ele anya na Muhammadu Buhari ga-apụta zọ ọchịchị iji mara ma a ga-enye ya agba nke abụọ, okwubeghị ma ọ ga-etinye ụkwụ na ya bụ ntụliaka 2019. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mmadụ anọ chọrọ ịna Buhari ọkwa ya Kedụ isi ụka Naijiria na Boko Haram? 'Achọghị m ị na-echekwube nwoke inye m ego'
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Afịrịka", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43557830
Enwe achụpụla ndị mmadụ na Legọs
Ndị bi na Soluyi/Sosanya dị na Legọs na-ekwu na nsogbu enwe na-enye ha akarịala, ha rịọrọ gọọmentị nyere ha aka.
2018-03-28T15:27:30Z
Enwe achụpụla ndị mmadụ na Soluyi/Sosanya dị na Legọs
Enwe Ndị mmadụ na-ekwu na nsogbu enwe na-enye ha abụghị ọbere ihe, ma kpọkuo gọọmentị ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka "Ị zụta ngwa nri dowe n'ụlọ gị, ị bata n'ụlọ otu ụbọchị ị hụ ka nri gị kwasara n'ala, ọ bụrụ na enwe akụwaala mpio gị, bata zuru nri gị." Ihe a bụ ihe ụfọdụ ndị na-ahụ na Legọs. Otu onye bi na Sosanya, Gbagada dị na Legọs, bụ Gabriel Wopariwa, gwara BBC Pidgin na "enwe na-enye anyị oke nsogbu". O kwuru sị "ọ bụrụ na ị debe nri gị n'ụlọ ma ị mechighị ọnụụzọ gị nkeọma, etu a ka enwe ga-esi bata richaa nri ị dowere." Akụkọ ga-amasị gị: Atiku etinyela ụkwụ na ndọrọndọrọ 2019 Kim Jong-un agaala China Obiano emeela onye Igala kọmishọna Agbataobi Soluyi na Sosanya bụ ebe ka na-emepe emepe maka na ọ dịbu ka ime obodo mbụ Wopariwa kwuru sị na ụfọdụ n'ime ha agabuola mkpesa na gọọmentị ime obodo Kosofe, mana onweghị ihe ha gatara. Ndị agbataobi ahụ na-arịọ ndị gọọmentị ka ha gbalịa chụpụ enwe ndị a maka na ha na-awakpozi ndị mmadụ ugbua. Ha kwuru na otu enwe busoro otu nwoke agha mere ka ebuga nwoke ahụ ụlọọgwụ, n'ihi na nwoke ahụ chụrụ ya ọsọ ka ọ chọrọ izuru akịbekee ya. Ndị bi n'agbataobi Soluyi kwuru na ha na-ahụbu enwe ndị a ka ha nọ n'osisi n'ime ọhịa mgbe ebe ahụ ka bụ ime obodo, mana ugbua enwe ndị a na-enyezi ha nsogbu Ichie Akin Adedoyin kwuru na o biela na Soluyi kamgbe afọ 1985. O kwuru na oge ebe ahụ bụ ime obodo enwe ndị a bi n'ime ọhịa, na ha-anaghị enweta mkpesa ọbụla, mana ugbua obodo ahụ bidoro imepe, ha enwetela mkpesa karịrị akarị. Ha kwukwara na o nwere otu nwoke bi ebe ahụ enwe ndị a na-agbakọ n'ụlọ ya, mere ha ji na-enyo ma ọ na-azụ ha azụ. Ka agbataobi ahụ na-emepe, enwe ndị a enweghị ebe ha ga-anọzị maka na asụchaala ọhịa dị n'ogige ahụ ma mechie ọwara oke osimiri dị ebe ahụ Onye ọzọ bi n'agbataobi ahụ bụ Joshua Okeke, kwuru na ọ na-eche na enwe ndị ahụ nwere ike ịbụ mmadụ maka etu ha si ahazi onwe ha. O kwuru sị na itinyegodiri ha nsị na nri debe, ha agaghị eri ya. O kwuru sị na enwe ndị ahụ anaghị achọ ụmụaka okwu, na ha na-egwusa ha egwuregwu, mana ha na-aba ndị okenye ọgụ. Ndị agbataobi Sosanya kwuru na enwe ndị a na-apụta site n'elekere isii ruo asatọ nke ụtụtụ, ma pụtakwa n'elekere ise nke mgbede oge ha na-ebido ịchọ nri. Ụjọ na-atụ ha ka enwe ndị a ebunyela ha ọrịa.
[ "Anụmanụ", "Legọsị", "Naijiria", "Ọdịmma anụmanụ", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-43552789
Kpọpụta Nnamdi Kanu
Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akpọla Enyinnaya Abaribe ka ọ kpọpụta Nnamdi Kanu ma ọ bụ ọ gaa mkpọrọ
2018-03-28T20:11:02Z
Ụlọikpe sị Abaribe kpọpụta Nnamdi Kanu
Nnandi Kanu n'ụlọikpe Abuja Abaribe, El-shalom na Tochukwu Uchendụ gbaara Nnamdi Kanu akaebe mgbe eji ya eji. Ụlọikpe ukwu nke Binta Nyako nọ n'isi ya enyela iwu ka Enyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ndị ọzọ kpọpụta Nnamdị Kanu n'ụlọikpe mgbe a ga-ekpe ikpe ya ọzọ n'ọnwa June ma ọ bụ ha aga mkpọrọ. Abaribe, onye ụkọchukwu ndị Juu bụ El-shalom na otu onye bi na Abuja bụ Tochukwu Uchendu gbaara Nnamdi Kanu akaebe e jiri tọpụ ya n'ụlọmkpọrọ. Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe maka imegidee ọchịchị ala Naijiria bụ onye a na-achọ achọ kemgbe ọnwa Septemba, afọ 2017 ka ndị agha Naijiria wakpochara ụlọ ha oge ha gbara Egwu Eke na mpaghara ahụ. Ka ebulitere ikpe ahụ, ọka iwu na ekpechitere ndị ahụ bụ Chukwuma Machukwu Umeh, kwuru na enyebeghị ha akwụkwọ ụlọikpe nke kwupụtara iw ọkụ ahụ onye ọkaikpe nyere. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị Mgbanwe ego: Dọla ọdaala n'akụkụ Naịra? Enwe achụpụla ndị mmadụ na Legọs Atiku etinyela ụkwụ na ndọrọndọrọ 2019 Gere akụkọ mere ụnyaahụ n'otu nkeji Ihe nkiri Na Facebook Live, anyị kpara maka ịdamba ntuliaka ji ndị Igbo nke bekee kpọrọ voter's apathy.
[ "Naijiria", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]