source
stringlengths
0
47
title
stringlengths
0
100
description
stringlengths
0
502
date
stringlengths
0
20
headline
stringlengths
0
113
content
stringlengths
0
9.43k
tags
sequence
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50231871
'O nweghi uru dị n'ịgba abụbụọrụ ndị dọkịta n'Anambra'
Kọmịshịona mgbasaozi bụ n'Anambra Steeti sị na gọọmentị dị na mbụ na-ebeanya n'okwu banyere ụgwọ ndị dọkịta.
2019-10-30T09:27:03Z
Anambra doctors give ultimatum: 'O nweghi uru dị n'ịgba abụbụọrụ ndị dọkịta n'Anambra'
Obiano Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ Gọọmentị Anambra Steeti ekwuola na o nweghi uru dị n'isi azụ banyere abụbụọrụ ndị dọkịta steeti ahụ sị ha ga-agba. Ndị dọkịta ụlọọgwụ Odumegwu Ojukwu dị n'Amaku Awka sị na ha ga-eme nke a n'ime izuụka na-abịa maaọbụrụ na gọọmentị azaghị oku ha kpọrọ ka e bulie ụgwọọnwa ha. Ihe mere gọọmenti Anambra steeti ka ji gba ndị dọkịta nkịtị Ndị uweojii: Anyị na-achọ dọkịta pịara nọọsụ ihe Mana Kọmishịọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Don Adinuba sị na gọọmentị dị na mbụ na-eleba anya n'ihe banyere ụgwọ ọnwa a. Adinuba sị na gọọmentị hiwere kọmitee nọ ugbua na-eleba okwu a anya kamgbe ọnwa Julaị ndị dọkịta kwụsịrị abụbụọrụ ha gbara. Adinuba sị ka ndị dọkịta a nwee ndidi na gọọmentị ga-emezu nkwa ha n'oge na-adịghị anya. Cheta na ha gbaburu abụbụọrụ nke mbụ ruo mgbe gọvanọ Willie Obiano kwere ha nkwa itinye anya n'inuli ụgwọ ọnwa ha. Ikpe bụ nke Chineke - Secondus Onyeisioche otu PDP bụ Uche Secondus ekwuola na ikpe niile dị n'aka Chineke Nke a na-abịa dịka ụlọikpe kachasị na Naịjirịa kpebiri na ọ bụ onyeisiala buhari meriri Atiku Abubakar nke PDP ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a. N'ofesi Onyeisiala mba Chile bụ Sebestian Pinera esepụla aka ile otu United Nation ọbịa n'ọgbakọ ọnọdụ ihueluigwen'ihi ngagharịiwe a na-eme na mba ya. Ọ sị na ọ bụ nwute ka o ji kagbuo ọgbakọ a kwesiri ịdị n'ọnwa Disemba kama na ime udo n'obodo ya ka dị mkpa. N'egwuregwu O ga-adịkwa kpọkpọ na mba Ịngland n'abalị a mgbe Chelsea ga-ele Manchester United ọbịa ebe Liverpool ga-anabata Arsenal n'asọmpi Iko Carabao. Manchester gbara Chelsea ọkpụ anọ chara na nzute ha n'afọ a ebe Liverpool gbara Arsenal ọkpụ atọ asatara otu Nkeji Ihe nkiri ga-amasị gị: Umu Naịjirịa arachaala Ecuador ka ofe ọha Ibrahim Sai'd (onye gbasara aka) nyere goolu atọ Ibrahim Sa'id zara Omekaagụ n'abalị Tuuzde mgbe o nyere goolu atọ nke Naịjirịa ji merie mba Ecuador na asọmpi iko mba ụwa maka ụmọnwoke na-akarịghị afọ iri na asaa. Mmeri a mere ka Naịjirịa tozuo ịgafe n'agba nke abụọ asọmpi a nke na-aga n'ihu na mba Brazil. Etu Naịjirịa si agbanwe etu esi ahụ bọọlụ ụmụnwaanyị Isaac Promise, ọgba bọọlụ Naịjirịa, alaala mmụọ n'afọ iri atọ na otu Cheta na ụmụ Naịjrịa ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ merie Họngarị n'asọmpi nke mbu ha gbara. Naịjirịa bụ ndị nke mbụ n'otu 'B' ebe ha ga-ezute mba Ọstralia n'ụbọchị Fraịde. Otu okwe si gbaa Aha otu egwu bọọlụ Naịjirịa maka ụmụnwoke akarịghị afọ iri na asaa bụ 'Golden Eaglets.' Ha eturula ugo na asọmpi a ugboro ise n'oge gara aga. Gịnị na-akpata ọnwụ ụmụaka? Nwa a mụrụ ọhụrụ. Amalitela nnyocha pụrụ iche n'Enugwu steeti iji chọpụta ihe na-akpata oke ọnwụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ na Naịjirịa. Nnyocha a ga-enye aka iji mata etu a ga-esi gbaa ya bụ ụzọ owere mgba ka o wee chie. Ntuliaka na Briten Ndị omeiwu Briten Ndị omeiwu mba Briten ekwetala na a ga-enwe ntuliaka n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Disemba afọ a ka ndị mmadụ were aka ha họrọ ndị ha chọrọ ka ha nọrọ n'ọchịchị. Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Boris Johnson kwuru na ntuliaka a ga-enye ya nkwado ọ ga-eji gaa n'ihu ịchọ ụzọ UK ga-eji si na European Union pụọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Gịnị bụ 'Operation Positive Identification' ndịagha Naịjirịa chọrọ imalite? Davido ọnwụchiela ụmụagbọghọ abụọ kparịrị ya? Anyị na-esi imi n'ala ịchọta ndị tọrọ Fada n'Enugwu - Ndị uweojii
[ "Chelsea", "United Kingdom", "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "FIFA", "Liverpool F.C.", "Manchester United", "All Progressives Congress", "Atiku Abubakar", "Bọọlụ", "Arsenal", "Ahụike", "Muhammadu Buhari", "PDP (People's Democratic Party)", "Brexit" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50231873
Supreme Court Ruling: Afa anyị gbara maka ntuliaka 2019 emezuola - Ipob
Ụlọikpe kachasị eweliela Buharị aka elu dịka onye meriri ntuliaka 2019.
2019-10-30T17:13:25Z
Buhari vs Atiku: Ihe ndi Igbo nwere agba na-ekwu maka mkpebi Ụlọikpe Kachasị
Getty/Obioha/Uwazuruike Otu ndị na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob n'ịchafụ ekwuola na mkpebi Ụlọikpe Kachasị na okwu gbasara onye meriri na ntuliaka onyeisiala 2019 agbaghị ha gharịị n'ịhị na ọ bụ eze ama na a ga-echi. N'ụbọchị Wenezde, Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa bụ 'Supreme Court' weliri onyeisiala Muhammadu buhari aka elu dịka onye meriri ntuliaka maka ọkwa onyeisiala e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a. Ụlọikpe akụpụla akwụkwọ Atiku gbara maka onye meriri ntuliaka 2019 Ọkaikpe Garba eburula oche n'ikpe Atiku na Buhari Mana ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Peace Chukwudi gwara BBC Igbo na ihe mere bụ mmezu afa nke otu Ipob gbara na o nweghi uru dị n'isonye na ntuliaka 2019. "Ọ bụ mmezu ihe Ipob kwuru na ọ baghị uru isonye na ntuliaka nke ekpebirila onye ga-emeri tupu a tụọ vootu." O kwukwara na mkpebi ahụ bụ amamikpe nye ndị si na ha ga echekwa vootu a tụụrụ ha ka mmiri ghara ịba ya ntị. "Nke a bụ ngosi ihe bụ iberibe bụ ịma eziokwu, ịhụ eziokwu mana kwenye n'asị." Buhari emeriela Atiku na 'Supreme Court' Onyeisiala Muhammadu Buhari Abubakar Atiku na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ 'Peoples Democratic Party' (PDP) gbara Buharị na ndị pati ya bụ 'All progressives Congress' (APC) akwụkwọ. Ha kwuru na Buharị na ndị APC mere nnukwu nrụrụaka na ntuliaka ahụ. Onyeisi ndị ọkaikpe na Naịjirịa bụ Tanko Muhammed na ndị ọkaikpe isii ọzọ so kpee ya bụ ikpe. Ha gụnyere: Bode Rhodes-Vivour, Kayode Ariwoola, Amiru Sanusi, John Inyang Okoro, Ejembi Eko and Uwani Abba-Ajji. Ha niile kwekọrịtara na ebubo nrụrụaka Atiku boro Buharị enweghi isi na ọdụ. Ụlọikpe mkpesa bụ 'Court of Appeal' ekwubuola na ọbụ Buhari meriri na ntuliaka ahụ dịka ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission' (INEC) si kwupụta. Mana Atiku na ndị PDP ekwetaghị nke mere ka ha buru ikpe ahụ pụ 'Supreme Court' nke bụ ụlọikpe kachasị na Naịjirịa. Ihe ndị ọzọ na-ekwu maka mkpebi ụlọikpe Ọ bụghị naanị otu Ipob otu,a ndị ọzọ nwere agba n'Igbo etinyela ọnụ na ya bụ mkpebi Ụlọikpe Kachasị. Lee ihe ha kwuru: Nke a ga-enye ohere maka onye Igbo ịbụ onyeisiala na 2023- Otu South-East for President 2023 N'uche ya, onye nchịkọta otu South East for President 2023 bụ Rev Okechukwu Obioha kwuru na "Ihe ọ pụtara na Buhari ga-ano ruo afọ ato na-abia tupu ndị Ọwụwanyanwụ bụ ndị ọ ruru "Mkpebi a bụ etu Chineke si kwuo. Buhari ga-achizi afọ asatọ, ọ(ọchịchị) gbadatazie na ndida Naijiria. PDP na APC kwesiri inye ọwụwaanyanwụ ọkwa onye ha zọrọ ha onyeisiala." Otu ahụ gara n'ihu rio Atikyu ka ọ nọgide na otu PDP ma kwado ha iwere onye Igbo dịka onye ga-azọrọ pati haọkwa onyeisiala n'afọ 2023. Ụlọikpe Kachasị dara ya- ọkaiwu Goddy Uwazuruike Goddy Uwazurike bu onye ọkaiwu ma burukwa onye bụ bụ aka Ikenga Obi adịghị Goddy Uwazuruike bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye bụbụ onyeisi Aka Ikenga mma maka mkpebi Ụlọikpe Kachasị n'okwu Atiku na Buhari. Uwazuruike siri na, "A gbasoghị ikpemkwụmọtọ na ya bụ ikpe." "Ụlọikpe Kachasị dara ya site na ịhapụ ilebanye anya n'ihe niile gbara ọkpụụ bụ isi okwu n'ikpe." "Anya onye ọbụla dị na ya bụ ikpe tupu egwu adagharia n'ikpe mgbegharị. Mkpebi a bụ ịwụ ụkwụ n'ala." Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Gịnị bụ 'Operation Positive Identification' ndịagha Naịjirịa chọrọ imalite? Ụmụ Naịjirịa arachaala Ecuador ka ofe ọha Imo State na ihe akụ ọnatarachi juputara n'ime ya Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Atiku Abubakar", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50232911
Kedu etu gọọmentị ga-esi chikọta ma hazie Soshal Midịa?
Gọọmentị Naịjirịa na-ama okwa etu ha ga-esi kwụsi ịbusa akụkọ ụgha na ịkpọ asị na Soshal Midia.
2019-10-31T07:21:25Z
Social Media Regulation: Kedu etu gọọmentị ga-esi chikọta ma hazie Soshal Midịa?
Soshal Midia Gọọmentị Naijiria amaala ọkwa na ọ dị mkpa ka ahazie ma chikọta soshal midia iji kwụsi ịbụsa akụkọ ụgha na ọkwụ ịkpọ asị. Mana ọtụtu ndị Naijirịa gbarụrụ ihu n'ihi nke a. 'Ụzọ ị ga-eji chekwa akara gị' Google enyela Naijiria ohere inweta intanet n'efu Kama enwere ụfọdụ mba hiwere iwu ha ji achịkọta ma na-ahazi Soshal Midịa. Mba ndị a gụnyere: Jamanị Mba Jamanị hiwere iwu nke ha kporọ 'NetzDG' n'afọ 2018 nke gbasatara ụlọọrụ soshal midia niile nwere mmadụ nde abụọ. Iwu a nyere ikike na ụlọorụ ndị a nwere elekere awa iri abụo na anọ iwepụ ihe ọbụla na-ezighi ezi. Ihe ise ị ga-eji amata 'bank alert' adịgboroja Ị nwereike kote buru maka ihe idere na soshal midia Ụlọorụ dara iwu a ga-akwụ gọọmenti nde Euro iri ise (€50M). Ebe mmadụ daara ya bụ iwu ga-akwụ nde Euro ise (€5M). Yuropian Yuniọn Iropịan Yuniọn megidere mgbasa ozi ndị oyi egwu na Soshal Midịa Ndị Yuropian Yuniọn gbagidere ụkwụ imegide ibusa akụko ma ọ bụ ihe onyonyo ndị oyi egwu. Dịka iwu ahụ sị kwuo, ụlọọrụ ọbụla na-ewepụghị ihe ngosi ma ọ bụ akụkọ oyi egwu n'ime otu awa ewepụtara ya ga-ata ahụhụ. European Union agbatịala okwu Brexit ruo ọnwa Jenụwarị 2020 Ọstrelia Mba Ọụstralịa nwere iwu maka nchịkọta Soshal Midịa Mba Ọstrelia nwere iwu megidere ndị ụlọọrụ soshal midịa niile hapụru akụkọ ma ọ bụ ihe onyonyo gosiri mkpagbụ na ọgbaaghara. Ọ bụru na ụlọọru ndị a ewepụghị akụko di otu a, ndịisi ụlọorụ ahụ ga-aga nga ihe ruru afọ atọ. Ụlọorụ dara iwu a ga-akwụ nha ga-eru ọkara pacenti iri n'ime uru ha nwetere n'otu afọ n'ụwa niile. Rọshịa Rụshịa nwere ikw intinye iwu dịka nke ndị Jamanị Mba Rọshịa nwere iwu na ihe niile gbasara ndị mba Rọshịa ụlọọrụ soshal Midịa ndị a jị arụ ọrụ agaghị esi Rọshịa pụo. Rọshịa na-atụanya itinye iwu yiri nke ndị mba Jamanị. Chaịna Mba Chaịna nwere Soshal Midia nke ha Chaịna machiri Twitter, Google na Whatsapp na obodo ha niile. Ha ji Sọshal Midịa nke ha bụ Weibo, BAidu na WeChat nọchie ha. China nwere igwe mmadụ na enyocha soshal mịdịa ịchọpụta akụko na ozi iwu ha megidere. Kedu ihe ndị Naijirịa nwere ikwu maka nke a Ndị Naịjirịa ji Soshal Midịa agbasa ozi Onye ọkammụta ihe gbasara mgbasa ozi na ịntanetị bụ Kelechi Nwosu kọwapụtara sị: Iwu ndị nke anyi nwere ụgbu a ga-ezu ichịkọta Soshal Midia. Ka gọomentị were iwu ndị dị adị megharịa ya tinye na Soshal Midịa. Iwu ọbụla ekwesighị igbochi ndị mmadụị ikwu okwu maka gọomentị n'ụzọ airi ezi Lee ihe ndị Naijiria na-ekwu na Twitter Otutu ndị dịka @Engr_Henry20 anabataghị iwu ga-emegide soshal Midịa, ọ kwuru sị Akụkọ ga-amasị gị: Ikpe Buhari na Atiku amalitela na 'Supreme Court' Gịnị bụ 'Operation Positive Identification' ndịagha Naịjirịa chọrọ imalite? Ụmụ Naịjirịa arachaala Ecuador ka ofe ọha Nna Odumegwu Ojukwu kpara akụ eriwe agwụ agwụ Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Twitter", "Germany", "Rọshia", "Facebook", "Naijiria", "Australia", "Instagram", "Social media" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50259679
Nnamdị Kanu ọ ga-alọta lie nne ya?
Dịka Ọkaikpe Binta Nyako kwuru uche ya maka Nnamdi Kanu, okwu a kpụ n'ọnụ ugbua bụ ma ọ ga-alọta?
2019-11-01T14:00:01Z
Nnamdi Kanu: Ohere adị ka nwa amadị a laghachite Naịjirịa?
Kanu Ọ tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya mgbe ọkaiwu Nnmadị Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor rịọrọ ụlọikpe arịrịọ ka ha weghachite iwu ha nyere ka ahapụ Nnamdị Kanu n'aka ebe nke Bekee na-akpọ "bail". Cheta na Kanu mejọrọ iwu e ji tụghapụ ya mgbe ọ gbara ihe ọkpọrọ ọsọ ndụ n'afọ 2017. Kpọpụtanụ Nnamdi Kanu - Ọkaiwu ya Ihe 5 Allen Onyema gwara Nnamdi Kanu 'Nnamdi Kanu anaghị atụ ụjọ maka ikpe ndị Naịjirịa' Ọ bụ atụmatụ ahụ ka Maazị Ejiofor jiri rịọ arịrịọ a mana Ọkaikpe Binta Nyako, bụ onye nyeburu ohere ntọghapụ aka ebe a, kpọrọ isiekwenkụ na ya agaghị enyekwa ohere a ọzọ. Ma kwukwa na etu obodo si kwụrụ ugbua, ọ bụ mkpọrọ ga-akara Maazị Kanu mma maka nchekwa ndụ ya. Mana, ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ bụ ihe mere Ọkaiwu Ejiofor ji arịọ ụdịrị arịrịọ a, ọkachasị etinye uche n'ọnọdụ o jiri hapụ Naịjirịa. Kepu kepu nlọta Maazị Kanu malitere mgbe ozi pụtara na nne ya bụ Ugoeze Nnenne Kanu alala mmụọ. Dịka usoro omenala Igbo ji kwụrụ, nwa kwesiri ịkwa nne na nna ya. Ọzọ bụkwa na Igbo na-achọkarị ili mmadụ na obodo ya. Nke pụtara na ụfọdụ na-eche na a ga-ebulata ozu nne Kanu, ọkachasị etu a ọ bụ Ugoeze. Kanu bụ onye aha ya ka ada ụda karịa n'ezinaụlọ ha, nke mere na ọ ga-abu onye ọtụtu mmadu ga-eji maka ya bịa akwamozu nne ya. Kepu kepu a rikwara elu mgbe akụkọ pụtara na ụfọdụ ndị Eze si Abia steeti rịọrọ gọọmentị ka e nye Kanu ohere ka ọ lọta bịa lie nne ya. Agbanyeghi na Maazị Kanu katọọrọ atụmatụ a, ajụjụ ndị mmadu were bụrụ ma Nnamdi Kanu ọ ga alọta bia lie nne ya? Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọnwa Epụrel nke 2019, Maazị Kanu sị na ya "na-alọta n'ike na-ebube". Kedu ebe gọọmentị Naịjirịa kwu? Ịmata nke nwereike ime, BBC Igbo gbara gọọmentị Naịjirịa ajụjụ ịmata ebumnuche ha maka nlọta Kanu. Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina sị na ọ bụ Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed nwere ikike ịza ajụjụ a. Ekwentị Maazị Mohammed n'onwe ya tigidere mkpu mana ọ zaghị BBC Igbo. Ebe ka Kanu kwụ? Ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor n'onwe ya si ka akpọghachị ya n'ime ugboro ugboro BBC Igbo kpọrọ ya. Mana, n'arịrịọ ọ rịọrọ ụlọikpe, Nnamdị Kanu, site n'aka Ejiofor, na-ajụ gọọmentị Naijirịa ma ọ ga-echekwa ndụ ya ma ọ lọta dịka ha napụrụ ya ikike ịgbapụta onwe ya. Nke a mere Ọkaikpe Binta jiri saa okwu ọ sara. Kanu na onwe ya sara Ọkaikpe Nyako n'akara Twitter ya sị ka ya na ezinaụlọ ya gwara gawa ụlọ mkpọrọ iji gbanarụ ntọrọ. BBC jụrụ ndị ọnụ na-eru n'okwu maka etu okwu a siri kwụrụ ugbua. Chidiebere Ike bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'Igbo tinyere ọnụ n'ọkwu a ka BBC gbara ya ajụjụ. Umahi: Nnamdi Kanu gaa ebe ị sara ahụ gaa chịrị akwa gị Maazị Ike sị na gọọmentị Naijirịa anaghị erubere ụloikpe isi nke mere na ụjọ kwesiri ịtụ Nnamdi Kanu. Ọ sị na ọ bụ onyeisiala ka ọ dịrị ihu na ndị mmadụ kwanyere ụlọikpe ụgwụ na nsọpụru dịrị ya. O kwuru na ọ bụghị iwu na Nnamdị Kanu kwesiri ịlọta maka olili nne ya. Maazị Ike kwuru na n'ụche ya, na Nnamdi Kanu agbaghị ọsọ kama na ọ bụ gọomentị Naijirịa chụrụ ya ọsọ. Ọ tụrụ arọ ka Kanu nọrọ ebe ọ nọ ka oge na-aga. Ọtụtụ ụmụ afọ Naịjirịa tinyere ọnụ na-ajụjụ BBC Igbo jụrụ banyere okwu a kwukwara dịka Maazị Ike. Ka ọ kwụ ugbua, Ọkaikpe Nyako ekwuola ka ulọikpe ya kwụ, ebe okwe dịzị bụ n'ọgbọ Ifeanyi Ejiofor na onye ọ na-anọchite anya bụ Maazị Nnamdi Kanu. Kanu na onwe ya kwuru na ọ bụ "ịnweta Biafra" ka ya mkpa mgbe BBC Igbo jụrụ ya na mkparita uka emere n'afọ 2019 ma ọ ga-anabata ohere ya na gọọmentị Naịjirịa ikpezi. Akụkọ ga-amasị gị 'Nnamdi Kanu anaghị atụ ụjọ maka ikpe ndị Naịjirịa' Onye bụ 'Sarah Baartman' a e ji maka ya adọri Dice Ailes? Kedu ndị bụ ndị 'catcham' a na-eze eze n'Aba? Golden Eaglets na nnụnụ ndị ọzọ feterela Naịjirịa ntụrụugo na bọọlụ Ihe nkiri ga-amasị gị
[ "Human Rights Watch", "Naijiria", "Nnamdi Kanu", "Ikpe", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50259685
Gịnị bụ ikuchi nwaanyị n'ala Igbo?
Iji gbochie ama nwoke ichi, ndị Igbo na-ekuchi nwunye onye nwụrụ anwụ.
2019-11-03T05:45:28Z
Igbo Marriage: Mgbe nwoke kwesiri ikuchi nwaanyị
Nwaanyị na-eri uju Ndị Igbo anaghị eji alụm dị na nwunye na ụmụaka egwu egwu ọkachasị nwa nwoke. Nganga nwoke mgbe ochie bụ ọba ji ya na etu ezinụlọ ya si jupụta n'ụmụaka. Kedụ ndị bụ "Ụmụada" n'ala Igbo? Uru ịjụ ajụjụ bara tupu alụmdi na nwunye Nwoke mụbara amụba na-ahụ onwe ya dịka nwoke zuru oke. Agbụrụ mmadụ bụkwa ihe ọzọ dị ndị Igbo mkpa. Gịnị mere ụmụntorobia Igbo anaghị alụ di na nwunye n'oge? Asambodo agbamakwụkwọ gị ọ bụ adịgboroja? Onweghị onye chọrọ ka ama nna ya chie nke mere na nwoke ga-agbalị lụọ nwaanyị ma kpewere chi ya ka ọ mụọ nwa nwoke. Nke a mere e ji atụ ilu sị na onye nwere mmadụ ka onye nwere ego. Kedu mgbe nwoke ga-ekuchi nwanyị? Duke Olueze Ukeje, nwaafọ Nwangele nke dị n'Imo steeti, kọwaara BBC ihe bụ ikuchi nwaanyị. O kwuru sị na mgbe dị nwaanyị nwụrụ, ma ha amụtara nwa ma ha amụtaghị nwa, a na-ajụ nwaanyị ahụ ma ọ chọro ị nọ ka ọ chọrọ ịla be nna ya. Ọtụtụ mgbe, nwaanyị ahụ na-ekweta na ọ ga-anọ na be dị ya. Uru ọmụgwọ n'omenala Igbo India: Idina nwunye maobụ di mmadụ abụghị njọ Mgbe ọ dị otu a, ọ bụ nwanne di ya ga-ekuchi ya. Otu ihe ọzọ dịkwa mkpa bụ na nwoke agaghị ekuchi nwunye nwanne ya nke ọ tọrọ. Ọ bụ nwanne ha nke nta ga-ekuchi nwunye nwanne ya. Mana gịnị ka a ga-eme ma ọ bụrụ na onye nwụrụ anwụ enweghị nwanne nwoke ọ tọtara? Dịka Ukeje si kwuo, mgbe ihe dapụtara otụ a, ọ bụrụ na ọpara amụtabeghị nwoke topụtara etopu, ọ diziiri ya ikuchi nwunye nwanne ya. Lee ụfọdụ iwu Naịjirịa megidere ụmụnwaanyị Ihe isii ọ na-eri ịgba akwụkwọ Katolik na Naijiria? Mana ọ bụrụ na ọmụtala nwoke topụtara etopu, mara na ọ bụ nwa ya ahụ ga-ekuchi nwunye onye nwụrụ anwụ. Kama ọ bụrụ na-enweghịzị nwoke fọrọ n'ezinụlo ha, nwanna ha bụ otu agbụrụ ga-ekuchị nwaanyị ahụ. Kedu onye ụmụ amụtara site na-ikuchi nwaanyị ga aza aha ya? Ukeje gwara BBC Igbo na ọ bụ aha nwoke nke nwụrụ anwụ ka ụmụ amụtara site n'ikuchi nwaanyị ga-aza. Nwanne nwoke onye ahụ nwụrụ anwụ ga-ewere mmanya gaa na nke ndi ọgọ ya gwa ha na-ọbụ ya ga-elekọta nwa ha nwaanyị. Ụmụ amụtara ga-azazị aha nwoke nke nwụrụ anwụ. Mana nwanne ya nwoke nwere ịke ịga lụgharịa nwunye nwanne ya ahụ. Ọ bụrụ na nke a mee, ụmụ ha mụtara ga-aza aha ya. Kedu ebe ụmụ amụtara na-ikuchi nwaanyị ga-ekete ọke? Ụmụ nwoke onye nwụrụ anwụ ga-ekete oke n'ụlọ nna ha nwụrụ anwụ. Kama ndị nke amụtara site na ikuchi nwaanyị ga-aza aha onye kuchịrị nne ha ma kete oke n'ama onye kuchiri nne ha. Ọ bụrụ kwanụ nwoke lụrụ ọtụtụ nwunye? Mgbe nwoke lụrụ ọtụtụ nwaanyị nwụrụ, ọpara ya ga alụwa ma kuchie nwaanyị ikpeazụ nna ya lụrụ. Kedu maka ụgbụ a? Ọkammụta n'ihe gbasara omenala Igbo bụ Gladys Udechukwu gwara BBC na mgbe ochie, ndị Igbo hụrụ ụmụaka n'anya ọkachasị nwa nwoke. O kwuru na ụgbua, onye na amụtaghị nwa nwoke ma ọ bụ na-amụtaghị nwa ọbụla nwere ike ịga kute nwa n'aka gọọmentị. Nke a bụ nke Bekee na-akpọ 'adoption'. 'I ga-alụ m' aghọọla 'lawa na ndokwa' A ka na-agba mkpe n'ala Igbo etu ọ dị na mbụ? Udechukwu kọwakwara na e nwere atụmatụ sayensị dị na nwunye nwere ike iji mụta nwa nwoke. O kwukwara na ọtụtụ ụmụnwaanyị gụrụ akwụkwọ agaghị ekwe ka nwanne dị ha kwuchie ha. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Gbachịnụ ndị asịrị nkịtị - Ndịagha Naịjirịa Ọkpụkpụ agbadola Manchester United n'olu na Bournemouth Nnamdị Kanu ọ ga-alọta lie nne ya? Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Omenala", "Ụmụnyanyị", "Alụmdịnanwụnye" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50282259
Ndị uweojii mba Ingland akpọọla m ka m lọghachị - Khafi BBNaịja
Ndị uweojii 'Scotland Yard' kwuburu na ha enyeghị Khafi ikike ka o sonye n'egwuregwu BBNaija.
2019-11-03T17:50:43Z
Khafi BBNaịja: Ndị uweojii mba Ingland akpọọla m ka m lọghachị
Khafi Kareem Nwaada Khafi Kareem nke sonyere n'egwuregwu 'Big Brother Naija' nwere ike ịlaghachi n'ọrụ ya dịka onye uweojii na mba Ịngland. Khafi gwara ndị ntaakụkọ oge ọ laghachiri UK na ya na ndịisi uweojii 'Scotland Yard' na-akpa nkata. 'Aka anyị adịghi na ihe nkiri Khafi na-eme' - Uweojii Ingland E nyela Khafi ọsọ n'ụlọ Big Brother Naịja Tacha atachaala ụkwa jaa eze na Big Brother Naija Ọtụtụ akwụkwọ akụkọ mba UK tinyere 'Mirror' na 'Daily Mail' depụtara nke a. Khafi kwuru na ndịisi ụlọọrụ ha na-ajụ ya mgbe ọ ga-alaghachi n'ọrụ. Cheta na ndị uweojii 'Scotland Yard' gbarụrụ ihu oge a hụrụ Khafi n'egwuregwu BBNaija. Ha kwuru na ha enyeghị ya ikike isonye na ihe omume ahụ. Ha kwukwara na ha ga-eleba okwu ahụ anya ma Khafi lọta. A chụpụrụ Khafi n'ụlọ 'BBNaija' ka egwuregwu ahụ gachara abalị iri asaa na asaa. Khafi oge ọ laghachiri UK Na mkparịta ụka ya na ndị ntaakụkọ, Khafi si na ya amabeghị mgbe ọ ga-alaghachi. "Mana ọ ga-abụ n'oge na-adịghị anya," dịka o si kwuo. "A hụrụ m ọrụ ichekwa obodo London n'anya nke ukwuu." Khafi gbara afọ iri atọ n'abalị atọ nke ọnwa Nọvemba Khafi nọ na Naịjirịa ugbua iji mee emume ncheta ọmụmụ ya. Taa bụ abalị atọ nke ọnwa Nọvemba ka ọ gbara afọ iri atọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Gịnị bụ ikuchi nwaanyị n'ala Igbo? Lekwa ihe Bobrisky kwuru maka njem ya isi na nwoke fee nwaanyị Nke bụ eziokwu dị n'akụkọ kwuru na ajọ mmụọ nọ n'ụlọ gọọmentị Anambra Steeti Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50285633
Ihe iri ị kwesịrị ịma maka etu Nnamdi Kanu si gbanahụ ndịagha Naijirịa
Ka afọ abụọ gachara, Nnamdi Kanu ekwuola etu o si gbanahụ ndịagha Naijirịa.
2019-11-04T05:52:46Z
Nnamdi Kanu: 'Ụzọ m sị gbapụ na Naịjirịa adịghị nfe'
Nnamdi Kanu Nnamdi Kanu agwala ndị ntaakụkọ etu o si zọọ isi onwe ya mgbe ndịagha Naijirịa biara iwakpo ya n'afaraukwu, Ụmụahia, Abia steeti. Lee ihe iri gbara ọkpụrụkpụ ọ gwara ha: Ọ bụ n'obodo Azumiri ka o si gbapụ na Naijirịa. O si Azụmiri banye Bene, Togo, Gana, Ịvorị Kost tupu o were rute Senegal. O kwuru na ọ meruru ahụ mgbe ndị agha wakporo ụlọ ya nke mere na okwesiri i na aṅụ ọgwụ maka ndụ ya. Nnamdị Kanu si na ha nọrọ n'oke oshimiri izuụka abụọ n'ime ntakịri ụgbọ. Ya na ndị ya na ya so nọ na oshimiri Atlantik, ma otutu mgbe ka ebili mmiri chọrọ ikpu ụgbọ ha. Ụjọ ndị nchekwa Naijirịa na-arụ ọrụ n'ofesi tụrụ ya. Kanu si na onweghi ike igwa nwunye ya na ezinulo ya ebe ọ nọ maka ndị nchekwa inye ha nsogbu. O sị na ọ bụ Senegal ka o si were gbaba mba Isreal. O kwukwara na o were ya afọ atọ i banye mba Isreal. 'Na Isreal ka obi m laturu ala ma ndụ m enwee nchekwa' dịka Kanu siri kwuo. N'aka nke ọzọ, Nnamdị Kanu site n'aka ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor, gwara ụlọikpe Naijirịa na ọ dị njikere ịbịa zara ọnụ ya ma ọ bụrụ na ha ga-echekwa ya. Nnamdị Kanu ọ ga-alọta lie nne ya? Ihe mere Nnamdi Kanu ji gbuo oge ikwupute maka ọnwụ nne ya Ọkaikpe ga-ekpe Nnamdi Kanu ikpe abịaghị ụlọikpe taa Mana ọkaiwu gọọmentị bụ Labaran Shuaibu ekwenyeghi na nke ahụ, bụ nke mere Ọkaikpe Nyako ji buga ikpe ruo ụbọchị iri na isii nke ọnwa Jenụwarị 2020. Akụko ga-amasị gị Gịnị bụ ikuchi nwaanyị n'ala Igbo? Ndị uweojii mba Ingland akpọọla m ka m lọghachị - Khafi BBNaịja Etu dị na nwunye zụtara ụmụaka abụọ si ma n'ọnya ndị uweojii Lekwa ihe Bobrisky kwuru maka njem ya isi na nwoke fee nwaanyị
[ "Naijiria", "Nnamdi Kanu", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/50286244
'Nwuchie onyeisi Miyetti Allah' - Samuel Ortom
Samuel Ortom nke Benue sị na-ekwesiri ịnwụchi onyeisi ndị Miyetti Allah maka ihe okwuru.
2019-11-04T08:03:57Z
Benue State: 'Onyeisi ndị Miyetti Allah ekwuruola ọnụ'
Samuel Ortom sị ka anwuchie Bodejo Nwanna ị nụrụ nke na-akpọtụ na Benue? Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue agwala onyeisiala Muhammadu Buhari ya nwụchie onyeisi ndị Miyetti Allah bụ Abdullahi Bodejo. Benue a kagbuola NYSC 'EFCC agbapeela akpa ego Benue' - Terver Akase Benue: ọchịehị egbuola ndị mmadụ ọzọ? Ortom sị na Bodejo na-ekwu ihe nwere ike ibute ọgbaghara n'obodo dị ka ọ sị na gọvanọ ọbụla chọrọ udo ga-amapụtarịrị ndị ọchị ehi ogige ha akpọrọ RUGA. N'akwụkwọ nke odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Terver Akase deputara ụnyahụ bụ Sọnde, Ortom sị na Bodejo gwara ndị gọvanọ ọbụla na-ewepụtaghị ala maka RUGA chee aka ghọrọ ya. Dịka ọ dere, " iburu gọvanọ ma iweputaghị ala maka RUGA, ị gaghị enwe udo na steeti gi". Ortom sị na ya bụ okwu were ike ịkpalite mmụọ ọgbaghara n'ime ndị mmadụ ma bụkwara mgbaama maka ihe ha na-echere ha n'ọdịnihu na Benue. O kwukwara na onweghị otu ọbụla kwesiri ịkarị iwu obodo. Otrom sị "anyị na-akpọkụ ka gọọmentị jide ya bụ nwaamadị ma maa ya ikpe ka iwu si di". Cheta na ndị otu a maraọkwa mwakpo obodo Guma na Benue n'ụbọchị bọrọ afọ ọhụrụ 2018. NLC echerela ndị gọvanọ aka mgba Ị nụrụ maka ụgwọọnwa opekatampe nke ndị steeti? Odeakwụkwọ ndị Nigeria Labour Congress bụ Emmanuel Ugboaja na-arịọ ndị omeiwu steeti niile ka ha gbaara gọvanọ ọbụla kpọrọ ekwo nkụ maka ya bụ ụgwọọnwa ụgbọ nwamkpi. O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ ụbọchị ụka. Dịka Ugboaja kwuru, " Gọvanọ ọbụla na-ekweghị ịkwụ ụgwọ opekatampe sị chutuo ya n'ọkwa". Cheta na otu jikọrọ ndị gọvanọ ekwubuola na ha enweghike ịkwụ karịa ka ha nwere ike. Ụgbọaja sị na ya ahụghị ihe ndị gọvanọ ga-eji sị na ha agaghị akwụli ya bụ ụgwọ maka na ha ga-emeli ya. Ọ sị na "ọ bụ arụ ị sị na ị gaghị akwụ ya bụ ụgwọ ebe ụfọdụ n'ime ha nwere ụgbọelu naani ha na-aba". Ogbunigwe adaala ndị ISWAP Ndi aghaụgbọelụ atụọla ogbunigwe na ọdọ ebe ndị Islamic State for West Africa bụ ndị ọmekataraihe puo ụjọọ nọ na Arrinna Ciki dị na Borno steeti. Akụkọ na-ekwu na ya bụ agha ha busoro ndị ọlụọ ọlaa ahụ ụbọchị Fraịde na Satọde gburu ọtụtụ n'ime ha. Ndị aghaụgbọelu nke Operation Lafia Dole sị na ndị otu ha na-ahụ na mmụọ nyopuru ụgbọala ndị omekome ahụ ka ọ na-agba were gbaara ha ama. Ọnụ na-ekwuru ndịagha ahụ bụ Commodore Ibikunle Daramola kwuru n'ụbọchị ụka na ndị ọjọo ahụ ji ebe ahụ mere ọnọdụ mwakpo ha. Commodore Daramola sị na ha mebiri ndị ọlụọ ọlaa ahụ ihe nke ukwuu. Ikuku ndụ dizi okeọnụ na Delhi Ikuku ndụ bụzị ikuku onwu na Delhi Ị nụkwara na ndị mmadụ anaghịzị ahụ ezigbo ikuku na Delhi dị n'India? Minista na ahụ maka isiobodo ha bụ Arvind Kejriwal etiela mkpu na ajọ ikuku sị na ụgbọala nakwa ụlọọrụ anaghịzị ekwe mmadụ kụrụ ikuku ndụ. A nụrụ na ọ sị na gọọmentị ha amalitela ịwepu ọtụtụ ụgbọala n'ụzọ. iji mee ka anwụrụ ụgbọala beleta n'ikuku. Anwụrụọkụ ekweghị ụgbọelu iri atọ febata ụbọchị ụka. Iwu ha tiri ugbua bụ na a ga-amalite ike ụbọchị ụgbọala ọbụla ga-eji agba n'ụzọ. Nke bụ ka ewere beleta ụgbọala n'ụzọ. Akwụsịla ọrụ ma ụlọakwụkwọ na Delhi ruo Tuzde. Minista ahụike na mba ahụ bụ Satyendar Jain agwala ndị mmadụ ka ha gbakpuo n'ụlọ ha ọkachị n'ụtụtụ nakwa mgbede. A chọpụtara na ihe sọ agbachụ ihe eligwe bụ ọkụ ndị ọrụugbo na-agba ahịhịa maka nkwado ọrụugbo. Oyi atụọ Niko Kovac Niko Kovac malitere ịchị Bayern kemgbe Julaị 2018 N'egwuruegwu, Niko Kovac abụghịzị ọnye nkuzi ndị Bayern Munich. Nke a sitere na ọkpụ ise Eintracht Frankfurt gbara ha na Bundesliga ụnyahụ bụ Sunday. Bayern satara naanị otu ọkpụ n'ime ya. Nke a bụ ogburu abụọ emeriri Bayern na sizinu a. N'agbanyeghị, Kovac na ahapụ Bayern Munich mgbe ha ruru nkatụ nke anọ n'ogogo lig ha bụ nke Borussia Monchengladbach nọ n'isi ha. Kovac bụ onye gbara afọ iri anọ na asatọ emeriela asọmpị iri anọ n'ime iri isii na ise ha gbagoro. Mana anyụbeghị ha ụdị ịkpakwụ a ndị Borussia Monchengladbach nyụrụ ha n'ime afọ iri gara aga. Bayern sị na ọchụchụ Kovac bụ nkwekọrịta ha na ya. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị Etu dị na nwunye zụtara ụmụaka abụọ si ma n'ọnya ndị uweojii Nke bụ eziokwu dị n'akụkọ kwuru na ajọ mmụọ nọ n'ụlọ gọọmentị Anambra Steeti Nnamdị Kanu ọ ga-alọta lie nne ya?
[ "Germany", "Naijiria", "India", "Benue steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50295552
Ihe gọọmentị Naịjirịa sị a ga-eme tupu ha agbapee 'border'
Gọọmentị Naịjirịa sị na ihe ndị ka a ga-eme tupu ha agbapee okeala ha na mba ndị ọzọ.
2019-11-05T06:47:21Z
Nigeria Border Closure: Ihe gọọmentị sị a ga-eme tupu ha agbapee 'border'
Seme Bọda Gọọmentị Naịjirịa n'abalị anọ nke ọnwa Nọvemba nyere ọnọdụ ihe ndị a ga-eme tupu ha agbapee okeala ha na mba ndị ọzọ bụ nke ha gbachiri kamgbe ọnwa Ọgọst. Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama na ndị komitii na-ahụ maka mgbachi okeala kwupụtara nke a n'Abuja. 'Rice akọọla n'ahịa n'ihi mmechi border' - Ndị ahịa Ọnọdụ ndị a bụ nke mịnịsta Onyeama gụpụtara gụnyere: Ngwaahịa ọbụla si mba na-esoghi n'ECOWAS na-abata Naịjirịa ga-anọ n'ime ngwugwu mbụ e ji mara ya. A ga-eburu ya site n'odụ ụgbọ mmiri ruo n'ebe okeala nke Naịjirịa. Ngwaahịa ọbụla ndị mba so n'ECOWAS rụrụ ga-emezu iwu na-achị nrụpụta ngwaahịa ndị ECOWAS ka aka ghara ịkwa ya. A ga na-arụpụta ọtụtụ ngwaahịa na mba ndị so n'ECOWAS. A ga-etinye ego ruru pasentị iri atọ n'elu ngwaahịa ọbụla si mba ndị ọzọ abata n'ECOWAS. A ga-ekpochapụ ụlọ ngwaahịa ọbụla dị n'agbata okeala Naịjirịa na mba ndị ọzọ. A ga-eke ngwaahịa niile a na-ebubata na Naịjirịa n'ime ngwugwu nke ya. A bịa n'ime njem n'okela Naịjirịa, ndị njem ga-enye akwụkwọ ikike a ma ama dịka akwụkwọ ejirimara mba onye. N'ime izuụka abụọ na-abịa abịa, gọọmentị Naịjirịa na mba ndị agbataobi ya dịka Nijee na Benin ga-enwe nzukọ ilebanye n'iwu ndị a. Ndị isi ụlọọrụ na-ahụ maka njem, mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ, na ndị ọrụ nchekwa ga-eso na nzukọ a. Akụkọ ndị ga-amsị gị: Gịnị ka ị ma maka 'Aba Women's riot' mere afọ 90 gara aga? Nne ụmụaka atọ ụlọ aja dagburu n'Ebonyi amabeghị na ha nwụrụ Akwamozu o kwesiri ịbụ oriri na nkwari?
[ "Ịji ego achụ ego", "Naijiria", "Njepụ", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Bini", "Ghana", "Niger" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50365025
Ihe Nnamdi Kanu sị na ya chọrọ n'aka gọọmentị Naịjirịa
Onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu enyela gọọmentị Naịjirịa ọnọdụ ọhụrụ ga-eme ka ya na ha nwee mkparịtaụka.
2019-11-10T11:55:13Z
Nnamdi Kanu: 'Ihe m chọrọ n'aka gọọmentị Naịjirịa'
Akụkọ dị mkpa: Nnamdi enyela gọọmentị Naịjirịa ọnọdụ ọhụrụ Nnamdi Kanu Onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu enyela gọọmentị Naịjirịa ọnọdụ ọhụrụ ga-eme ka ya na ha nwee mkparịtaụka. N'ozi si n'aka odeakwukwọ Ipob bụ Emma Powerful pụta, Kanu sị na ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa jiri obi ọcha kpọ ya oku n'obodo ọzọ nakwa n'ihu otu United Nation. Kpọpụta Nnamdi Kanu Ihe 5 Allen Onyema gwara Nnamdi Kanu Ọ sị na oku a ga-abụ maka ihiwe mgbe na etu a ga-eji mme ntuliaka nwereonwe ndị Biafra bụ 'Referendum'. Kanu gara n'ihu kwuo na ihe mere o ji a chọ ebe ọnọdụ dị mma maka mkparịtaụka bụ maka mwakpo ndịagha mere n'ụlọ ya n'afọ 2017. Ọ sị na ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa chọrọ ịgba ya ajụjụ, na gara ezite ndị DSS maọbụ ndị uweojii kama izite ndịagha ka e gbuo ya na 2017. Kanu sị na ugbua nne ya anwụọla, ahụ esichaghị nna ya ike n'ihi mwakpo ndịagha mere n'ụlọ ha. Ụmụaka a lụnyere dị ka nkụ na Naịjirịa - UNICEF Ndị ugwụ Awụsa kachasị nwe ụmụaka anaghị aga akwụkwọ na Naịjirịa Ngalaba United Nation na-ahụ maka ụmụaka bụ UNICEF sị na Naịjirịa kachasị nwee ụmụaka a lụnyere di na nwata n'Afrịka. Ozi ha wepụtara ụnyaahụ na Bauchi Steeti kwuru na ụmụnwaanyị dị nde iri abụọ na atọ na Naịjirịa bụ ndị a lụrụ dị na nwata. Onaiyekan alaala ezumike nka Onyeisi ụka Katọlik n'Abuja bụ 'John Cardinal Onaiyekan' alaala ezumike nka. Iwu ụka Katọlik kwuru na ndị ụkọchukwu ga-ala ezumike nka ma ha gbaa afọ iri asaa na ise. Naịjirịa nọ n'ọnọdụ ọgbaghara - Onaiyekan Ọ bụrụ m bụ onyeisiala, a kara m iritu n'ọkwa - Onaiyekan Onaiyekan gbara afọ iri asaa n'otu n'ọnwa Janụwarị afọ a. Akwụkwọ ozi si n'aka ndịisi ụka Katọlik n'Abuja kwuru na Pope Francis ahọpụtala Ignatius Kaigama dịka onye ga-anọchị anya Onaiyekan. Akpabio ọ ga-ahapụzị mịnịsta lagachi ịzọ ọkwa Sịnetọ? Ụlọikpe mkpesa kagbuola mmeri Chris Ekpeyong meriri Godswill Akpabio n'ịzọ ọkwa sịnetọ ga-anọchịteanya Akwa Ibom West. Ụlọikpe a nyere iwu ka e megharịa ntuliaka a n'okpuruọchịchị Essien Udim bụ ebe obodo Akpobio dị. Akpabio agbaala arụkwaghịm Godswill Akpabio: Lee ihe ndị na-akpọtụ maka ọpụpụ ya Pati PDP n'Akwa Ibom nabatara ikpe a ma kwuo ha nwere olileanya imeri Akpabio ọzọ. Dịka ọ dị ugbua Akpabio ji ọkwa mịnịsta na-ahụ maka Niger-Delta. Ajụjụ a bụrụ ma ọ ga-agbahapụ ọkwa mịnịsta zọọ nke sịnetọ? NYSC achụọla ụmụagbọghọ abụọ n'Ebonyi Steeti Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ngalaba NYSC chụpụrụ ụmụ agbọghọ abụọ bịa iji otu afọ efe ala nna ha n'Ebonyi Steeti. Akụkọ a sị na ụmụagbọghọ ndị a jụrụ iyi 'Traouser' dịka o megidere okpukperechi ha. N'ofesi Evo Morales Onyeisiala mba Bolivia bụ Evo Morales ekwetala na ya ga-akagharị ntuliaka elu ọzọ n'ihi ebubo ndị mbaụwa na-ebo ya na o ji nrụrụaka wee merie ntuliaka nke mbụ e mere n'ọnwa Ọktoba. Nke a bụ nke ugboro anọ Morales na-azọ ọkwa onyeisiala Bolivia, ọ malitere ịchị mba ahụ n'afọ 2006. Ọkụ ọhịa egbuola ihe ruru mmadụ atọ ma ma chụsịa ọtụtụ ndị mmadụ n'ụlọ dị n'Ostrelia. Ndị ọrụ gbatagbata sị na ihe karịrị ire ọkụ otu narị ka na-agba na mpaghara South Wales nakwa Queensland. N'egwuregwu Ndị otu egwu bọọlụ Manchester United mere ka ọbụghị ha taa mgbe ha ji ọkpụ goolu atọ a satara otu merie ndị Brighton. Etu ahụ kwa ka Liverpool si merie ndị Manchester City. Lionel Messi nyere goolu atọ mgbe ndị Barcelona ji ọkpụ goolu anọ asatara otu merie Celta Vigo n'ụbọchị Satọde. Nke a mere ka Barcelona gbagoro n'elu tebulu 'La Liga'. Nwafọ mba Briten na-akwụ ọkpọ bụ KSI emeriela ogbo ya nke Amerịka bụ Logan Paul n'asọmpi ọkpọ ha kụrụ na Los Angeles. N'asọmpi Premier League nke ehihie a Manchester United na Brighton ga adọbiri ya ebe Liverpool na Manchester City ga-ezute ibe ha. Nkeji Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Okike", "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ikike ụmụnwanyị", "Barcelona", "Bọọlụ", "Akwa Ibom Steeti", "Ụmụntoroọbịa", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50368537
Liverpool apịwaala Man City ọnụ ka ụdara ụgụrụ
Liverpool jizi akara itoolu agafe Man City na tebulu 'English Premier League' ka ha tichara ha ihe.
2019-11-10T18:34:07Z
Liverpool vs Manchester City: Liverpool apịwaala Man City ọnụ ka ụdara ụgụrụ
Van Dijk na Mane Ndị Liverpool gosiri ndị Manchester City nkarị na mgbede ụbọchị ụka n'asọmpi "English Premier League". Ọkpụ goolu atọ chara acha ka ndị akwa ọbara ọbara ji pịwaa ndị akwa anụnụ anụnụ ọnụ ka ụdara. Liverpool apịala Chelsea ụtalị mmụọ Man Utd ahụla Liverpool teta n'ụra ọnwụ Liverpool agwọọla Arsenal ka abacha e tinyere ose Nsukka Tupu asọmpi a ebido, onye ọbụla nọ na-ekwu na ọgụ ahụ ga-aka aka. Mana ngwangwa egwu malitere Liverpool gosiri ihe ha ji bụrụ di na-alụ ndị Man City. Naanị nkeji asaa ka o were Fabinho iji were 'shot' dịka egbeigwe gbawaa neetị ndị Man City. O teghi aka Mohammed Salah mezuo ya abụọ na nkeji 13. Mohammed Salah nyere goolu nke abụọ Man City malitere ịgba lịkalịka ka ndi mmiri na-eri mana nke ahụ amịtaghị mkpụrụ. Mkpu niile ha tiri ka igwe VAR nye ha penariti oge bọọlụ kụrụ Alexander-Arnold n'aka dara n'ala aja. N'agba nke abụọ, Mane mezuru ya goolu atọ nke mere ka ndị Man City tọkịrị. Ka ọ dị ugbua Nke a pụtara na Liverpool jizi akara itoolu agafe Man City na tebulu EPL. Man City bụzị ndị nke anọ. Akụkọ ga-amasị gị: Manchester United emewela ụwa 'shut up' Leicester City ewerela egbe ndị Arsenal gbawaa ha isi Nwaanyị achọghị iyi 'trouser' n'ogige anyị ya kwara laa - Onyeisi NYSC Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Egwuruegwu", "Manchester City", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50376180
Tam David-West anwụọla n'afọ 83
Onyeisiala Muhammadu Buhari sị na ọnwụ Tam David-West metụtara ya ọfụma.
2019-11-11T14:00:27Z
Tam David-West anwụọla n'afọ 83
Tam David-West Onye bụbu Minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ Tam David-West anwụọla n'afọ 83. Onyeisiala Mụhammadu Buhari riri uju maka ọnwụ Maazị David-West rụrụ ọrụ n'okpuru ya n'akara Twitter ya. Maazị David-West bụbu onye ọkammụta n'ihe banyere nje ma rụọ ọrụ dịka Minista site n'afọ 1983 ruo 1985 mgbe a chuturu Buhari n'ọkwa dịka onyeisiala. Ọ rụkwara dịka Minista na-ahụ maka ọnatara chị, ọkụ nakwa igwe n'oge ọchịagha Ibrahim Babangida. Ka Buhari malitere njem ị bụ onyeisiala ọzọ n'afọ 2015, David-West so na ndị kwenyere na ya nke ọma. Ọ gwara BBC mgbe ahụ na Buhari ga-eme ọfụma, ọkachasị n'ebe o si metụta mmanụ agbịdị site n'ihazigharị ngalaba ahụ ma rụzie ụlọọrụ mmepụta mmanụ Bekee kpọrọ "refinery". Naịjirịa amalitela ihiwe ebe a na-arụ ụgbọ oloko Gọọmentị etiti amalitela ịrụ ụlọọrụ ebe a na-emepụta akụrụngwa ụgbọ oloko na Kajola dị n'Ogun Steeti. Ọ bụ osote onyeisiala bụ Yemi Osinbanjo hiwere ntọala e ji arụ ụlọọrụ a n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba. Amaechi ọ ga-aza oku senate kpọrọ ya? Ụgbọ Oloko egbuola mmadu abuo na Milan Mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi sị na ụlọọrụ a dị n'okporoụzọ oloko si Legọs gawa Ibadan ga-abụ nke mbụ na Naịjirịa. Ọ sị na a ga-eji ya arụpụta akụrụngwa ụgbọ oloko dị iche iche eji arụ ọrụ na Naịjirịa nakwa na mba ndị ọzọ. Ọ sị na ọ bụ ụlọọrụ China Civil Engineering Construction Corporation (CCECC) na-arụ ya site na nkwekọrịta ha na mịnịstrị ụgbọala nwere n'afọ 2018. Ụlọọrụ CCECC sị na ha ga-arụpụta ụgbọ oloko dị narị ise n'ime otu afọ.. Osote onyeisiala Osinbanjo sị na ijikọta ọdụ ụgbọmmiri na nke ụgbọ oloko ga-eme ka azụmaahịa na Naịjirịa nakwa Afrịka mụbaa. N'ofesi Oke ọgbaghaara dị na mba Bolivia maka arụkwaghịm n'ọrụ onyeisiala ha bụ Evo Morales gbara n'ihi ngagharịiwe ha mere ọtụtụ izuụka megide maka ntuliaka ọjọọ. Morales rituru n'ọkwa ngwangwa onyeisi ndịagha ha pụtara n'ọha sị ya hapụ ọkwa ya. N'egwuregwu Onweghi ntaramahụhụ a ga-enye onye nchịkọta Manchester City bụ Pep Guardiola maka agwa ọ kpara mgbe Liverpool meriri ha n'asọmpị ụnyaahụ. Mgbe a jụrụ Guardiola, ọ sị na o nweghi ihe ọjọọ o mere karịa 'Daalụ nke ukwuu' ọ sịrị onye ogbu opi bọọlụ Nkeji Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Manchester City", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Bọọlụ", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50387181
Ndị ahịa Ọnịcha eweputala 25m iji rụọ ụzọ ahịa ha
Ndị ọchịchị ahịa Headbridge Ọnịcha agbakọọla aka malite ịrụ ụzọ ahịa ha mebiri kemgbe afọ iri anọ na asaa.
2019-11-13T13:06:11Z
Onitsha Fire Update: Ndị ahịa 'Bridge Head' eweputala 25m iji rụ ụzọ ahịa ha
Ahịa gbara ọkụ n'ọnịcha n'ọnwa Ọktọba Ahịa gbara ọkụ n'ọnịcha n'ọnwa Ọktọba Ndị ahịa akpọrọ Head Bridge dị n'ọnịcha amalitela ịrụ ụzọ bara n'ime ahịa ahụ nke mebiri kemgbe afọ iri anọ na asaa. Ha kwuru na ha na-eme nke a iji belata ahụhụ ha bụ ndị na-azụ ahịa na-ata ebe ahụ maka ụzọ ọjọọ. 'Ụmụ gị na-ebe akwa, agụụ gị na-agụ anyị' 'Ọkụ gbapịara ahịa mgbuka n'Uwelu, Benin metụtara ewu na ọkụkọ' Nke a mere na ego ha mapụtara maka ọrụ a bụ nde naira iri abụọ na ise ma kwuo na ụzọ ahụ ga-esi ebe akpọrọ 'Tinker Section' rue 'Niger street' Dịka ụlọntaakụkọ Sun siri kwuo, onyeisi otu ndị na-azụ ahịa ebe ahụ bụ Sunday Obinze kwuru na aka gọọmentị adịghị na ya chaa chaa. "Ọ bụ n'ihi iwu Gọvanọ Obiano nyere gbasara ụzọ dị n'ahịa ka anyị ji hibe ọrụ a" ka ọ kọwara. N'aka ọzọ, gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ha anụbeghị maka ọrụ a chaa chaa. Kọmịshọna mgbasaozi bụ Don Adinuba kwuru na "nke a bụ mbụ anyị na-anụ maka akụko nke ahụ" Ọ gbalịrị itinye anya na ya gwa anyị ihe nchọpụta ya pụtara. Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo na-agbalị ịnweta ụfọdụ mmadụ n'ime ahịa ịnụ olu ha. Akụkọ ndị ga-amasị: Ihe 5 ndị nwere ọtụ kwesiri ịma Nwata Igbo dị afọ 12 ewepụtala ụzọ ọhụrụ esi arụ 'Maths' Ị ma na ọ bụghị oyi na-ebute Pneumonia?
[ "Naijiria", "Anambra Steeti", "Ahịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50415967
E menyụola ọkụ na-agba n'ọdọahịa dị na Yaba
Ọkụ gbara ụlọelu bụ ebe obibi ma bụrụkwa ọdọahịa n'ahịa Yaba dị na Legọs, mana ọ taghị isi mmadụ.
2019-11-14T13:06:35Z
Fire in Yaba: E menyụola ọkụ na-agba n'ọdọahịa dị na Yaba
Ebe ọkụ na-agba na Yaba Akụkọ na-eru anyị ugbua bụ na ndị ọrụ gbatagbata emenyụọla ọkụ na-agba n'otu ọdọahịa dị n'ahịa Yaba dị na Legọs n'ehihie Tọọzde. Ndị nọ ebe ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ọkụ ahụ bidoro n'ọnụ ụlọ otu onye, mana etu ọ dị, onweghị onye nwụrụ. Ha kwuru na ọ bụ ngwa igwe ọkụ a kwụnyere n'ọkụ latrik nwuru ọkụ ka e wetara ọkụ. Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ bịara mana ha ahụb=ghị ohere gbanyụ ọkụ ahụ ngwangwa n'ihi igwe mmadụ gbakọtara ebe ahụ. Mana ha mechara gbanyụọ ọkụ ahụ. Ụlọọrụ gbatagbata Legọs a kpọrọ Lasema n'aha ịchafụ kwuru na o nweghị onye nwuru n'ọkụ ọgbụgba, naanị mmadụ abụọ merụrụ. Ha gbara ama n'ọkụ ahụ kpara ike nke mere ụlọ ahụ jiri gbawacha aja ụlọ ahụ mee ka ọ daa. Burna Boy ga-arịọ anyị mgbaghara - ndị ntorobịa South Afrịca Burna Boy Ọtụtụ ndị ntoroọbịa mba Saụt Afrịka ekwuola na Burna Boy ga-arịọ ha mgbaghara tupu ọ bata obodo ha ọzọ. Nke a bụ maka ihe Burna Boy kwuru n'oge a wakporo ụmụ Naịjirịa bi na Saụt Afrịka. Mwakpo 'Xenophobia' ataala isi mmadụ ruru 600 kamgbe 2006 Nyenu ụmụ Nigeria ohere anyị nyere unu - okwu Buhari gwara South Africa Ụmụafọ Naịjirịa dị 314 esila Saụt Afrịka lọta Burna Boy bụ onye otiegwu Naịjirịa aha ya na-ewu ewu n'ụwa niile. N'oge ahụ, o kwuru na ya agaghịzị atụ ụkwụ na Saụt Afrịka ọzọ ruo mgbe gọọmentị mba ahụ ga-akwụsị ogbugbu a na-egbu ụmụ Naịjirịa ebe ahụ. Burna na onye otiegwu Saụt Afrịka aha ya AKA, sere nnukwu okwu n'ihi ya bụ ihe. Ugbua, Burna kwuru na e nwere emume a kpọrọ ya ka ọ bịa kụọ egwu na Saụt Afrịka. O kwuru na ego a ga-akwụ ya n'emume ha agaghị aba n'akpa ya kama ọ ga-agara ụmụ Naijirịa e mebiri ihe ha na mwakpo Xenophobia n'oge gara aga. Mana ndị ntorobịa Saụt Afrịka na-ekwu na soshal midia na Burna ga-arịọrịrị ha mgbaghara tupu ha ekwe ya ịbata obodo ha ọzọ. Ụfọdụ kwuru na ha edegarala gọọmentị akwụkwọ ka Burna Boy ghara ịtụ ụkwụ na be ha. Atọhapụla ọkaikpe ndị ntọrị ji Ọkaikpe Chioma Nwosu-Iheme enwerela onwe ya. Ọnụ na-ekwuru ndị uwe ojii na Edo steeti bụ Chidi Nwabuzor gwara BBC Igbo na nke a bụ eziokwu. Mana okweghị ekwu etu ọkaikpe ahụ si nwere onwe ya. Cheta na ndị ntọrị nwụchiri Ọkaikpe Nwosu-Iheme na Benin, isi obodo Edo Steeti n'abalị iri atọ nke ọnwa Ọktoba. Ndị ekperima ahụ gbagburu onye uweojii na-eche ya nche tupu ha akpụrụ ya. Sowore na ndị DSS Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019 Ndi ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ State Security Service ka na-ekwusị ike na ha agaghị atọhapụ Omoyele Sowore ganye na ndị gbaara ya aka ebe abịa ịkpọrọ ya. Peter Afunanya, onye okwuru ọra ndị DSS kwuru na Femi Falana, bụ onye ọkaiwu Sowore, ma ihe o kwesịrị ime tupu atọhapụ ya, mana ọchọghị ime ya. Bayelsa aghọọla ọgbọ agha Gọvanọ Seriake Dickson gara leta ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ Mmadụ abụọ nwụrụ n'ebe ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' mere ịchụ nta vootu na Bayelsa Steeti n'ụbọchị Wenezdee. Nke a mere n'obodo Ogbolomabiri nke dị n'okpuru ọchịchị Nembe na steeti ahụ. Ụmụokorọbịa anya na-acha ọkụ bucha egbe dabata n'ama egwuregwu 'King Koko Square' ma chụsasịa ndị mmadụ. 'Tinye nwa gị n'ụlọakwụkwọ maọbụ ije nga' Obodo Brass abanyela oriri n'elu Whale Ndị mmadụ ka nọ na-eche onye Douye Diri bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ na pati PDP mgbe ya bụ ọgbọaghara malitere. Onye ọkwọụgbọala nke Radio Bayelsa na otu onye ọzọ bụ ndị mgbọ tụgburu. Ọtụtụ ndị ọzọkwa merụrụ ahụ. Ha nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ. Claire Pierangelo N'otu aka ahụ, mba Amerịka ekwuola na ha ga-ata ndị ọbụla tinyere aka n'ọgbaaghara na Bayelsa Steeti ahụhụ. Onye nnọchiteanya mba ahụ na Naịjirịa bụ Claire Pierangelo kwuru na onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla aka ya dị n'ọgbaaghara agaghị enwe ike ịba Amerịka ọzọ. Pierangelo kwuru na anya Amerịka na-eke ka ọkụ na ya bụ ntuliaka a ga eme n'ụbọchị Satọdee. Akwa mmiri 'Third Mainland' a na-ama jijiji? Ụjọ atụla ụnụ. Gbachịnụ ndị asịrị nkịtị. Akwa mmiri 'third mainland' siri ike, ọ naghị ada. Nke a sị n'ọnụ gọọmentị etiti gbasara asịrị na-efegharị na akwa mmiri ahụ na-amazi jijiji nke na o nwere ike ịda. Ebola enweela ọgwụ mgbochi Otu ahuike mba ụwa akwadola otu n'ime ọgwụ ndị arụpụtara maka iji gbochie ọrịa ebola. World Health Organisation kwuru na nke a ga-enye aka iji hụ na ọrịa ọjọọ a kwụsịrị ịgbasa n'ọtụtụ mba Afrịka dị icheiche ebe ya bụ ọrịa na-akpa mkpamkpa ugbua. WHO kwuru na a ga-amalite ịgba ndị mmadụ ọgwụ ahụ n'aafọ 2020. Super Eagles enwetala mmeri Mmeri ka Naịjirịa ji malite asọmpi e ji akwado maka iko mba Afrịka nke afọ 2021 n'ama egwuregwu dị n'Uyo, Akwa Ibom Steeti ụnyaahụ. Benin Repọblik bu ụzọ gbaa aka ahịa mana Victor Osimhen na Samuel Kalu nyetere goolu abụọ Naịjirịa ji wee merie. England na Montenagro Mba England na ndị Montenagro ga-ezute onwe ha taa n'asọmpi nkwado maka egwuregwu Euro 2020. Naanị otu akara ka ọ fọdụrụ ka Ịngland tozuo oke iso na ya bụ egwuregwu. Ndị ọzọ ga-agba bọọlụ n'abalị taa gụnyere: Tọkị na Aịsland, Pọtụgal na Lithuania, Fransị na Mọldova Akụkọ ga-amasị gị: Gịnị bụ ọrịa shuga nakwa ụzọ ị ga-esi gbalahụ ya? Anyị gburu Eke ogba ọ bụghị Eke Idemmili - Ndị Oba Ihe 5 ndị nwere ọtụ kwesiri ịma Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Bayelsa Steeti", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Bọọlụ", "South Africa", "Abụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/50424306
Ihe Busola Dakolo kwuru maka ụlọikpe ịkụpụ akwụkwọ ọ gbara
Busola Dakolo ekwuola na ya ga-agbagharị akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị n'ikpe ebubo idina n'ike o boro ụkọchukwu ụka COZA bụ Biodun Fatoyinbo.
2019-11-14T18:25:42Z
COZA Pastor Vs Busola Dakolo: Lee ihe ụlọikpe kpebiri
Biodun Fatoyinbo na Busola Daokolo Dịka ụlọikpe kụchapụrụ akwụkwọ Busola Dakolo gbara onyeisi ụlọụka COZA bụ Biodun Fatoyinbo maka ebubo ịwakpo ya n'ike, Busola ekwuola na ya ga-agbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpegharị. Ọkaikpe Othman Musa onye kpere ya bụ ikpe kwuru na e nweghị ihe nọ n'ime ya n'ihi na o teela aka ya bụ ihe mere afọ iri na isii gara aga mere. "Esepubeghi m aka n'ikpe mụ na Fatoyinbo" Ụkọchukwu Coza jụrụ ịza oku kọmitii anyị hibere inyocha ebubo e boro ya - PFN Dịka akụkọ ahụ pụtara , obi adịghị ọtụtụ ndị mmadụ mma n'ihi na hụtara ya na ọ ga-eme ka ndị a wakporo n'ike na-atụ egwu kpọpụta onye metọọ ha. Ọtụtụ ndị na-akwado ụkọchukwu COZA na-enwe aṅụrị maka mkpebi ahụ. Mana Busola site n'akwụkwọ mgbasaozi ọkaiwu ya bụ Pelumi Olajengbesi binyere aka kwuru na ọkaikpe ahụ elebanyeghị anya n'isi okwu akwụkwọ ahụ ha gbara. O kwuru na-agbanyeghị akụkọ na-eduhie ụzọ nke na-efegharị nke kwuru na aka Fatoyinbo dị ọcha, na nke bụ eziokwu bụ na "e lebanyebeghị isiokwu anya." Ihe mere ụmụnwaanyị ji akwado di ha ma e bo ha ebubo Ihe ise nwaanyị ga-eme iji nweta ikpe ziri ezi ma a kwaso ya iko n'ike "Ihe BIODUN FATOYINBO, na-ekwu site n'ọnụ ndị ọkaiwu ya bụ ka ụlọikpe ghara ilebanye anya n'okwu n'ihi na ọ bụ ihe mere oge tereela aka." "Ya mere anyị ga-aga n'ụlọikpe dịkarị elu ka ha nyonye anya n'okwu ahụ." Nathaniel Bassey o kotela ebu maka okwu COZA? Cheta na ọnwa ole na ole gara aga, Bussola , onye bụ nwunye otiegwu a ma ama bụ Timi Dakolo kwụpụtara na mkparịtaụka ya na otu ụlọọrụ ntaaakụkọ nwere na Fatoyinbo wakporo ya oge ọ dị n'obere. Akụkọ ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ikike ụmụnwanyị", "Abuja", "Ụmụnyanyị", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50386376
Lagos, obodo na-anaghị ehi ụra
Nnọọ na Legọs; obodo na-anaghị ehi ụra, ebe nchekwube na ndị nwere nchekwu juru, ebe ihe ọbụla na ihe niile nwereike ime - ma ọ bụrụ na oke ịkwụ n'ahịrị ha anọchighi gị ụzọ.
2019-11-15T06:11:24Z
Lagos ọ bụ obodo pụrụ iche n'Africa?
Ihe a kpụrụ akpụ Idejo nke na-asị gị "nnọọ" ma ị bata Legọs Ihe a kpụrụ akpụ Idejo nke na-asị gị "nnọọ" ma ị bata Legọs Nnọọ na Legọs; obodo na-anaghị arahụ ụra, ebe nchekwube na ndị nwere nchekwu juru, ebe ihe ọbụla na ihe niile nwereike ime - ma ọ bụrụ na oke ịkwụ n'ahịrị ha anọchighi gị ụzọ. Ịza aha otutu na-adị ndị Naịjirịa oke mkpa na Naịjiria, ọ bụkwa ihe e ji egosiputa ọkwa mmadụ ọkachasị ebe ndị nọ n'ọchịchị nọ, dịka Nduka Orjinmo nke BBC nọ na Legọs si kwuo. Ihe ịhụnanya Jazz na-ebute Gọvanọ atọ ndị ọzọ sị ka a kwụsị ịkpọ ha 'His Excellency' Nna Odumegwu Ojukwu kpara akụ eriwe agwụ agwụ Legọs bụ steeti kachasị pee mpe na Naịjirịa ma a bịa n'ebe ala ha, mana ebe ọ na-eburughi ka o ji agwa mezuo. Site n'oge i si n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammad pụta, ị ga-ahụ ihe mere o ji bụrụ oke obodo mepere emepe, siri ike dị egwu. 'Omenaala itinye uchu n'ọrụ' N'agbanyeghi na Abuja nọchiri ya dịka isiobodo Naịjirịa n'afọ 1991, ọ bụ obodo obi nwereike ịka gị ịsị na ọ bụ ya kacha mkpa, obodo a na-agba mbọ nakwa mpaghara dị ezigbo mkpa. E si n'elu sere foto ahịa Jankara dị na mpaghara Legọs Aịlandị bụ ebe a na-azụ ahịa Ndị Naịjirịa si na gburugburu mba a, n'agbụrụ dị iche iche, na-agba mbọ dị iche iche, na-awụbata 'ọgbọ nke mgbata mbọ' ebe ha na-achọ ma ọ ga-adabara ha. Obodo a bụ ebe obibi nye ọtụtụ ụlọọrụ sitere na ndị nke agba ochie dịka ụlọọrụ mmepụta na ụlọakụ, ruo ndị nke agba ọhụrụ dịka teknụzụ na iji teknụzụ agbasa ozi na mkparịtaụka, ọ bụkwa ebe ọdọụgbọmmiri abụọ kachasị mkpa na mba a dị nakwa ebe ọtụtụ ahịa na-ewu ewu a na-ere ihe niile gụnyere ma akwụkwọ, nka makwa eletrọniks dịkwa. Ebe a na-ere akwụkwọ na Legọs Aịlandị "Anyị nwere nnukwu omenaala itinye uchu n'ọrụ rara ahụ ịchọta ebe ọzọ," ka Funmi Oyatogun, onye hibere TVP Adventures, ụlọorụ na-ahụ maka njem nlegharịanya kwuru. "Na Legọs, onye ọbụla na-achọ ịrụ ihe ọzọ a ga-akpụ n'ọnụ, igbo mkpa nke ọzọ na-ewelite isi, ịrụpụta ihe onye ọbụla na-achọ maọbụ ihe ga-egbo mkpa ndị mmadụ, ya na-eme ka ike ghara ị na-agwụ obodo a ma mekwaa ka ọ bụrụ mepere emepe". 'Mmụọ ịgba mbọ' Na Legọs, oke mkpọtụ na-adịkarị; nke si n'opi ụgbọala, nke si n'igwe na-enye ọkụ latrik nakwa nke ndị mmadụ ruru nde kwuru nde na-agagharị mkpa ha na-eme; ọsọ ya bụrụ ụkwụ ka ha ji aga, ọgbatumtum, ụgbọala (ọkachasị danfo na-acha edo edo bụ nke e ji mara obodo a), maọbụ ụgbọala BRT bụ ndị ọgbara ọhụrụ, ndị Legọs ruru mmadụ nde 21 anaghị anọ otu ebe. Ahịa dị na mpaghara Oshodi ebe ma mmadụ ma ụgbọala kwụ n'ahịrị A na-atụ anya na mmadụ ka ga na-amụbanye ma ruo nde 88 n'afọ 2100, nke ga-eme ka mmadụ karịa n'obodo na-enwechaghị ihe owuwu na-ezuru ya ugbua. Mana ndị Legọs bụ anwụ anwụ. "Ndị bi na Legọs dị iche," ka Chimamaka Obuekwe bụ onye hibere ụlọọrụ njem nlegharịanya The Social Prefect Tours kwuru. "E nwere ụdịrị mmụọ ịgba mbọ obodo a nwere. Ike anaghị agwụ ya agwụ, egwuregwu na-amasị ya, ọ na-anabata mmadụ." Nwoke na-azụta Suya N'ihi nke a, ọ bụghị ebe ga-ejiri nwayọ dọbata gị n'ime mmemme ya na-anaghị akwụsị akwụsị; ọ naghị emere mmadụ ebere, ọ naghị agbaghara, ọ naghị aga nwayọ nwayọ. Ụzọ ị ga-esi na-aga nke ọma n'ime ya bụ site n'inwe ụzọ ị ga-esi nọkwata, gbado anya nakwa dị njikere maka ihe ọbụla Legọs ga-eweta. 'Isiobodo Omenala' Mana o nwere ihe ọzọ eji mara Legọs karịa azụmahịa, o teela aka a na-ahụ ya dịka isi oboso omenala mba Naịjirịa. Njirimara a jisike na-ebiri ọkụ dịka ejije, egwu nakwa ejiji mba ahụ na-abawanye. Aduke Shitta-Bey na-egosiputa ekike n'izuụka Lagos Fashion nke afọ 2018. Nollywood, ụlọọrụ ejije nke bụ atọ na mbaụwa niile bụ ebe ka isisụlọọrụ ya dị. Ọ bụ n'ọnwa atọ na ngwụcha afọ ọbụla ka emume n'uju n'ihe metụtara nka, odideakwụkwọ, ejije, egwu nke so egosi ụtọ ndị mmadụ nwere ebe ihe ndị Naịjirịa dị. Ndi egwu Femi Kuti's na New Afrika Shrine di na Lagos "Ọ bụ obodo kachasị na-akpọtụ akpọtụ m hụrụla n'Afrịka niile" ka Oyatogun kwukwara. "Ọ bụ omume nwere ume kachasị, mmekọ anyị, mmemme anyị nakwa etu anyị si emume bụ ọpụrụiche n'ebe mpaghra ndị ọzọ dị". "Ike ndụ agaghị agwụ gị na Legọs" Mmemme bụ ihe ọzọ eji mara Legọs n'ihi na ndụ abalị ya bụ nke ude ya na-ede. Mgbe ọbụla ịchọrọ o nweriri ebe mmemme na-aga n'ihu site n'ụlọ mmanya dị icheiche, ụlọ oriri na nkwarị na ebe ndị ọzọ na-akpọ egwu Burna Boy, Wizkid nakwa dike Afrobeats a ma ama bụ Fela. Legos nwere ya. Ndị egwu Afrobeat na-amasị na agba egwu n' "Afrika Shrine" "Ị nwereike ị ga ụlọ mmanya nakwa ụlọ egwu dị ọtụtụ na Legọs ma ghara izu ike kama otu nkeji," ka Obuekwe kwetara. "Ọ bụ ogige egwu na mmemme, abịa na ihe ịnweta onwe gị, ike ndụ agaghị agwụ gị na Legọs" Otiegwu a ma ama bụ M.I Abaga na-eti egwu na Legọs Mana ọ bụrụ na ịbụghị onye mmemme na-amasị, ị na-achọ ihe enweghi oke mkpọtụ, Legọs nwekwara ya. N'agbanyeghị na eji ndụ ọsọ ọsọ mara Legọs, e nwere ikpere mmiri, ọhịa ezumike nakwa ebe a na-echekwa anụmanụ ebe e nwere okporoụzọ imeọhịa kachasị to ogologo n'Afrịka. Nwaanyị na-elegharị anya n'ime ọhịa Lekki Conservation Centre dị na Lagos. "E nwere otu akwụkwọ, otu ịgba ọsọ, otu Yoga, otu ezumike ụbụrụ ebe ndị mmadụ nwereike ị ga gosipụta onwe ha, anyị nyere mmadụ aka bido ọgbakọ ndị na-agba ọtọ" ka Emeka Okocha bụ onyeisi ogige mmeme akpọrọ 'Nothingto Do in Lagos'. Ọ bụrụ na ọ gụrụ gị agụ ịme nyocha na obodo a, ị ga-achọta ihe ga-amasị gị"
[ "Omume", "Legọsị", "Naijiria", "Legọsị steeti", "Abụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50430324
Lee steeti kacha nwee ọrịa HIV na Naịjirịa
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa HIV na Naịjirịa ewepụtala etu ihe sị kwụrụ n'afọ 2019.
2019-11-15T18:30:15Z
HIV Prevalence in Nigeria: Anambara kacha nwee ọrịa HIV n' ala Igbo
Steeti ise akachasị nwee ọrịa HIV na Naịjirịa Steeti ise akachasị nwee ọrịa HIV na Naịjirịa Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa ori nchekwa ahụ bụ Human Immunodeficiency Virus ewepụtala etu ihe si gbata kwụrụ gbasara ọrịa ahụ na Naịjirịa. 'National Agency for the Control of Aids' (NACA) wepụtara nke a n'ọba ozi ha. HIV/AIDS: Ihe mere asọmmiri ejighi ebufeli nje HIV Ụzọ ị ga-esi gbalahụ ibufe nwa ọhụrụ gị HIV A maala ụkọchukwu sị na ọ na-agwọ nje HIV ikpe Dịka nnyocha ahụ si kwuo, ndị nwere HIV na Naịjirịa niile agbadatala otu pasentị na ụma anọ (1.4%). N'afọ gara aga, ha dị otu pasentị na ụma ise (1.5%) Akwa Ibom bụ steeti kacha nwee HIV na Naijiria, ebe Katsina bụ steeti opekarịị mpe. Ndị nwere ọrịa HIV na Akwa-Ibom steeti dị pasentị ise na ụma isii (5.6%), . Ndị na-esote ha bụ Benue steeti (4.9%), ebe Rivas steeti bụ ndị nke atọ (3.8%). Steeti kacha nwee ọrịa HIV na mpaghara ọwụwa anyanwụ Na mpaghara ọwụwa anyanwụ, Anambara steeti kacha nwee ndị nwere ọrịa HIV. Ndị nwere ọrịa ahụ n'Anambara dị pasentị abụọ na ụma anọ (2.4%). Enugwu (2.1%) na Abịa (2.1%) bụ ndị nke abụọ na nke atọ. Mpụtara ule waec agbaala Ngalaba na-ahụ maka ụlọ sekọndrị bụ Waec ewepụtala mpụtara ule ahụ nke ngwụcha afọ. N'ime mmadụ puku itoolu na anọ na ụma (94,8840) lere ule ahụ, mmadụ puku iri anọ na itoolu na ụwa ( 49,679) ndị bụ pasent 52.36 mere ọfụma na sọbjet ise gụnyere maọbụ gụpụ®ụ 'English' maọbụ 'Mathematics.' Naanị pasent 35.10 ndị lere ule ahụ nwetara mpụtara ndị mma na sọbjet ise gụnyere 'English' na "Mathematics." Ntuliaka Bayelsa na Kogi David Lyon na Duoye Diri Ugo eberela na mgbagbu na Kogi nakwa Bayelsa Steeti ebe a ga-enwe ntuliaka maka ọkwa gọvanọ na Satọdee. Ọtụtụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ga-eso zọọ ya bụ ntuliaka. Yahaya Bello na Musa Wada Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ otu APC maọbụ PDP ka ọkwa ahụ ga-agara. BBC Igbo ga na-ewetara gị etu ya bụ ntuliaka si aga n'uju. Ọba nchekwa ahụ nwaanyị A gbapeelaa ọba nchekwa ebe ndị mmadụ nwere ike ịga kirie ma mụtakwa ihe gbasara ahụ nwaanyị na London. Ndị rụrụ ụlọ nkiri a kwuru na ebumnuche ha bụ iji kọwara ndị mmadụ ihe gbasara ahụike ụmụnwaanyị. Dickson Etuhu ọ ga-aga nga? Dickson Etuhu played at the World Cup and the Africa Cup of Nations for Nigeria A ga-aga ụlọikpe mkpegharị n'isi Dickson Etuhu gbabuuru Naịjirịa bọọlụ, bụ onye e jidere ka ọ na-anwa ịzụ maachị. Ma ndị gbara ya akwụkwọ ma ndị ọkaiwu na-anọchite anya ya ekwuola na ha ga-achọ ka e kpegharịa ikpe ya ka a chọtachara ya ihe n'aka. Amaju Pinnick 'azọkarala nsị aboki'? Anyị ga-amachị unu n'ike - FIFA na-adọ Naịjirịa aka na ntị Fifa enyela Chelsea oche azụ N'ụbọchị 13 nke ọnwa Nọvemba 2019, ụlọikpe mkpegharị dị na Stọkọlm kwuru na o doro anya na Etuhu na otu onye ọzọ na-agbabu bọọlụ nwara ịzụ maachị site n'aka oche goolu otu egwuregwu AIK bụ Kyriakos "Kenny" Stamatopoulos, n'afọ 2017. N'aka ọzọ, Marakwa na otu Dream Team bụ ndị na-anọchite anya Naịjirịa n'Olimpiks ga-ezute ma nwee ohere ịzọkasị Saụt Afrịka n'asọmpi abalị Fraịdee. Asọmpi a nke eji etozu maka Olympics 2020 ga ebiri ọkụ n'elekere asaa nke mgbede Fraidee. Ụgbọelu kụrụ afọ n'ala n'Enugwu, Ngalaba ndịagha ụgbọelu Naịjiria ekwuola na ọ bụ eziokwu na otu ụgbọhelịkọpta ha dara kpọkasịa n'Enugwu, kama na enweghi onye merụrụ ahụ. Ha kwuru na ha na-enyocha ihe butere ya bụ ihe mberede. Aisha Buhari na-ewu, Iwe ji ndị mmadụ na soshal midia makana nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Aisha Buhari so arịọ ndị Kogi steeti mgbaghara maka gọvanọ ha. Nke a mere ka a kpụrụ ya n'ọnụ kemgbe. N'ofesi, Ndị mba Họng Kọng malitere ngagharịiwe ọnwa ise gara aga Mba Họng Kọng adabanyela riseshọn mere ya nke mbụ n'ime afọ iri, ka ngagharịiwe ha mewere kemgbe ọnwa Juun afọ a ka na-ebiri ọkụ. Akụkọ si mba ahụ apụta kwuru na akụnaụba obodo ha ji ihe ruru pasentị atọ na ọma takpọọ ebe ngwụcha Septemba karịa etu ọ dị n'ọnwa ndị gara aga. Boko Haram eriela mbombo ọsọ ka agha tara isi ndị otu ha 13 Ndịagha Naịjiria egbuola ndị Boko Haram iri na atọ ma merụọ ọtụtụ ahụ mgbe otu abụọ a kwatara ya n'obodo Mallam Fatori dị na Borno steeti. Ka ndị Boko Haram riri mbombo ọsọ, ndịagha tụtara ọtụtụ ngwaagha gụnyere ogbunigwe, egbe ruru iri asatọ nakwa uwe ndị agha. Ntuliaka Kogi steeti, Gọvanọ Nasir El-Rufai nọ na-ebe ndị APC na-eme nkwado maka ntuliaka rịọ ndị Kogi steeti ka ha gbaghara gọvanọ Yahaya Bello n'ụzọ ọbụla o si mejọọ ha. Nke a na-abịa dịka a na-akwado ntuliaka ọkwa gọvanọ na Kogi steeti na Bayelsa n'ụbọchị satọdee. N'ofesi, A gbachiela ụlọakwụkwọ ahụ na ndị ọzọ dị ya nso Ụmụakwụkwọ abụọ anwụọla ebe mmadụ atọ merụrụ ahụ ka otu nwoke gbawara egbe n'ụlọakwụkwọ dị na Santa Clarita dị na Kalifonia na mba Amerịka. Ndị uweojii na-eche na ọ bụ nwata gbara afọ iri na isii nke ọ bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya, kpara arụ a. N'egwuregwu, Federer meriri Djokovic Roger Federer apịapụla Novak Djokovic n'asọmpi tenis bụ ATP nke a na-eme na Lọndọn. Ka ọ dị ugbua, Federer ga-ezute onye meriri n'etiti Rafael Nadal na Stefano Tsitsipas. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a: Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Boko Haram", "Naijiria", "Kogi steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50386378
Gịnị ka ị ma maka Chinua Achebe debanyere aha ya n'obi ndị Naịjirịa?
Dịka ihe Chinua Achebe detere n'aka na-ewu n'ụwa niile, akụkọ a na-egosi ụmụ Igbo ihe ha kwesịrị ima maka dimkpa a.
2019-11-16T10:17:21Z
Chinua Achebe: Etu o si debanye aha ya n'obi ndị Naịjirịa
Chinua Achebe Ọ bụrụ na Chinualumogu Albert Achebe dị ndụ, ọ gaara adị afọ 89 ugbua. Ị bụrụ onye Igbo maọbụ onye Naịjiria ma ị nụbeghị, hụ maọbụ gụọ akwụkwọ o dere bụ 'Things Fall Apart', gbara ọsọ gaa weghachị akwụkwọ ikike na-egosi na ị bụ onye Naịjirịa. Gịnị ka ị ma maka Eni Njoku; nwaafọ Igbo isi ya na-apụ ọkụ n'agụmakwụkwọ? Gịnị ka ị ma maka Buchi Emecheta? Nna Odumegwu Ojukwu kpara akụ eriwe agwụ agwụ Achebe nwụrụ n'n'ụbọchị 21 nke ọnwa Maachị afọ 2013 oge ọ dị afọ 82, bụ otu onye ndị Igbo na akụkọ Igbo agaghị echefu echefu ma ọlị, ọkachasị maka ụdịrị mbọ ọ gbara oge agha Biafra. Ọ bụ maka akụkọ ndị o dere maka agha Bịafra, ka ọ bụ maka akụkọ mmụta gbasara nkuzi ihe na-eme n'ala Igbo nakwa Naịjiria? Achebe ejighi ụjọ biri. Achebe ekweghi anara nturuugo "Commander of the Federal Republic" nke gọọmentị Naịjiri na-enye ugboro abụọ, n'afọ 2004 na 2011 Mgbe ọ dị ndụ, Achebe a ma ama na mpaghara mbaụwa, a na-akpọ "mpa ide akụkọ Afrịka n'ụzọ ọgbara ọhụrụ", dere akwụkwọ karịrị iri nakwa ọtụtụ mbem. Achebe ji akpa kpokọọ nturuugo karịrị iri atọ na mahadum dị iche iche dị na mbaụwa. Ngwa lee ihe ị kwesịrị ịma maka ya: A mụrụ ya n'Ogidi dị n'Anambara steeti n'ụbọchị 16 nke ọnwa Nọvemba afọ 1930. Ọ nọbu na-agụ maka Ahụike na mahadum Ibadan ka e nyere ya ohere ịga akwụkwọ n'efu, mana ọ gbaghapụrụ ya gaa gụọ Bekee, Akụkọ mgbe gboo na Nkammụta ofufe. Ọ lụrụ nwunye ya bụ Christie Okoli bụ onye o zutere n'ụlọọrụ ya, n'afọ 1961. Ha mụrụ ụmụ anọ. O si n'aka nne ya na nwanne ya nwaanyị mụta etu e si akọ akụkọ. Ọ bụ onye nkuzi, ode mbem, ode akwụkwọ nakwa onye ntaakụkọ nke BBC kuziiri. Akwụkwọ ndị e ji mara ya gụnyere 'Things Fall Apart, Chike And The River, No Longer At Ease, Arrow Of God, A Man Of The People, Anthills Of The Savannah, There Was A Country, dgz. O so malite ụlọọrụ ntaakụkọ a ma ugbua dịka 'Voice Of Nigeria (VON). Oge agha Biafra, o mere ka ọha mara na o jighi Biafra egwu egwu; ya na ụfọdụ ndị enyi ya na-abụghị ndị Igbo sere ezigbo okwu maka ihe gbasara ya. N'afọ 1990, ọ dabanyere n'ihe mberede okporoụzọ mee ka o nwetu obere mkpọnwụ ahụ ma tinye ya n'oche e ji ebu ndị ọrịa. Oge ọ gaara adị afọ 87, ụlọorụ Google sere ya ka ụwa niile mara ya ma ha na-achọ ihe n'elu intanetị Achebe zutere ọtụtụ ndị aha ha na-ada ụda na mbaụwa, ndị gụnyere Nelson Mandela nke chịburu Saụt Afrịka Lee ndị Igbo ọzọ na-ede akwụkwọ ka Achebe: Akụkọ ga-amasị gị: Lee steeti kacha nwee ọrịa HIV na Naịjirịa Ndị a ma ama ụzụ tụrụ n'isi ha n'izu a Ị ma ndị na-arụ ọrụ ndị uweojii n'ala Igbo mgbe gboo? Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Agụmagụ", "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Akwụkwọ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50446451
Ọkụ agbagbuola Fada ụka Katọlik, a tọrọ ọzọ
Ọkụ gbagburu otu Fada n'ụlọụka St Peters Katọlik dị na Nnewi, Anambra Steeti.
2019-11-16T19:15:05Z
Fire Outbreak: Ọkụ agbagbuola Fada n'ụlọụka Katọlik
Ọkụ gbara otu Fada ebe a tọrọ nke ọzọ Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha na-enyocha ihe mere otu ụkọchukwu ọkụ gbagburu n'Nnewi, Anambra steeti. Ọkụ agbagbuola otụ ụkọchụkwụ Katọlịk a kpọrọ Fada Edmond Nwagbala n'ụlọụka St. Peters Claver Katọlik dị na Nnewi Ichi Uruagu dị n'Anambra Steeti. Gịnị na-ebute oke ọkụ ọgbụgba na Tanka? Ọkụ ọgbụgba agbagbuola ụmụaka ruru 26 Ndị bi nso ebe ihe mere kwuru na ha n'ụlọ ha nụ ka ihe gbara ha gbapụta ị mara ihe dara ụdọ ahụ were hụ ọkụ na-agba n'ụlọ Fadaa ahụ 'ebe elekere mbụ nke isi ụtụtụ Satọdee. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Muhammed sị na ọkụ a malitere ịgba n'elekere anọ nke isi ụtụtụ 16 Nọvemba, 2019. Ọkụ a na-amabeghi ihe kpatara ya gbara ebe obibi ụlọụka ahụ bụ ebe Fada Edmund Nwagbala dị afọ iri isii bi ma gbaa ya nke a na-amaghị onye ọ bụ. Ọtụtụ nsogbu pụtara n'ụfọdụ steeti ebe e mere ọgbakọ nke okpuru ọchịchị a n'izu ụka gara aga Haruna sị na ndị ọrụ nchekwa uweojii ngalaba Otolo nakwa ndị na-agbanyụ ọkụ wụchiri ebe ahụ bịa gbayụọ ọkụ a. Ngwa ngwa ebu Fada Edmund gawa ụlọọgwụ mana e kwupụtara ọnwụ ya, e tinye zie ya n'ụlọozu maka nyocha. Ọ sị na kọmishona ndị uwojii n'Anambra bụ John B. Abang enyela iwu ka a malite nyocha tara ọchịchị banyere nke a. N'aka nke ọzọ, a tọrọla Fada ọzọ n'Enugwu Ndị ntọrị tọrọ Fada Theophilus Ndulue, nke ụlọụka St. Patrick Katọlik Ihuonyia, Amansi-Odo, dị n'okpuruọchịchị Ezeagu n'Enugwu Steeti. Nke a mere na mgbede ụbọchị Fraịde 15 Nọvemba, 2019, Mgbe o si nzukọ ndị ụkọchukwu na-alọta. A tọhapụla Fada a tọrọ n'Enugwu Onye ọbụla gburu Fada Clement Ugwu bụ onye abụrụ ọnụ - Ụmụnwaanyi Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ụlọụka a bụ Fada Benjamin Achi mere ka a mata nke a. Ọ sị na a tọrọ Fada Theophilus na onyeisi ndị ụmụnwaanyị bụ ha mechara tọhapụ dịka otu awa gachara mana Fada a ka nọ n'aka ndị a. Ndị ntọrị a akpọbeghi ezinaụlọ Fada Theophilus maọbụ ndị isi ụlọụka maka ịjụ ajụjụ n'isi ya. Nke a ga-abụ ugboro ise ndị ntọrị na-atọrọ ndị ụkọchukwu Katọlik n'Enugwu Steeti.
[ "Naijiria", "Ụka ndị Roman", "Enugu Steeti", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50402464
'School Father' ekotala okwu na FUTA
Ndị isi Mahadum Federal University of Technology Akure (FUTA) ekwuola na ha ga-ata ụmụakwụkwọ megburu nwata akwụkwọ ibe ha ahụhụ.
2019-11-17T08:35:18Z
FUTA: Anyị ga-ata ụmụakwkwọ wakporo ibe ha ahụhụ
Akụkọ maka ụlọakwụkwọ Ndị isi 'Federal University of Technology Akure(FUTA) ekwuola na ha ga-ata ụmụakwụkwọ Mahadum ahụ na-emegbu nwata akwụkwọ nwaanyị ibe ha n'onyonyo na-efegharị n'elu soshal midia ahụhụ. Ọnụ na-ekwuchitere Mahadum ahụ bụ Adegbenro Adebanjo n'ime ozi o zitere BBC kwuru na ha ga-enyocha ka ha chọpụta ihe butere ya bụ mmegbu karị were ndụ nwata nwaanyị ahụ akụrụ ihe. Ndị nchekwa Naịjirịa na-ememina ndị mmadụ mgbe niile - Amnesty International Ihe mere Igbo ji achụpụ mmadụ n'ajọ ọhịa O kwuru na Mahadum FUTA na-ese ihu nye ya bụ agwa ma na-ekwu na ha ga-emeriri ihe niile iwu na-echekwa ụmụakwụkwọ kwuru gbasara ndị kpara agwa ọjọ a. Adebanjo kwuru na Mahadum ahụ na-eleta ya bụ nwata akwụkwọ nwaanyị etikasịrị ihe n'ụlọọgwụ. Aka akparala onye nkuzi na-eme ka nwata akwụkwọ rachaa ya utu tupu o bufee ya Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ondo steeti bụ Femi Joseph kwuru na otu nwata akwụkwọ ọ gaghị akpọpụta aha ya kpọrọ ya gwa ya maka mmegbu a mana ọ dụrụ ya ọdụ ya kpesara ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla kachasị dị nso. Joseph kwuru na nwata akwụkwọ ahụ akpọbeghị ya gwa ya ma ọ gazikwara kpesa nke ndị ọrụ ya. O kwuru na ọ bụrụ na ya bụ ihe mere n'ụlọ obibi ụmụakwụkwọ dị na Mahadum, ha ga-esi n'aka ndị isi FUTA nwuchie ya mana ọ bụrụ na o bi n'ụlọ n'adịghị n'ogige Mahadum, ha ga-eji aka ha ga nwuchie ya. O kwuru na etu o si na dị , ha ga-anwụchiriri onye kpara agwa ọjọ a. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia maka onyonyo a na-efegharị Ohakwe Prince tinyere ọnụ n'okwu site n'ịkọwa ihe ọhụrụ n'onyonyo a. Cindy Oluchi kwuru na e kweisiri ịnwụchị nwoke mere ihe a. Blank kwuru na ọ bụrụ na anwụchịghị onye kpara agwa a na ọ ga-adị mma ka emechie FUTA. Akụkọ ndị ga-amasị gị: 'Zik of Africa'; Nwoke ndị Igbo ji eme ọnụ Gịnị ka ị ma maka Chinua Achebe debanyere aha ya n'obi ndị Naịjirịa?
[ "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Ikike diri mmadụ", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50446449
Usoro e ji eli nwaanyị n'ala Igbo
Ihe ndị Igbo na-eme iji hụ na a kwanyere nwaanyị ugwu ikpeazụ ruru ya bụ ili ya nke ọma dịka ọ nwụchara.
2019-11-17T16:47:48Z
Igbo funeral rites: Usoro e ji eli nwaanyị n'ala Igbo
Ụmụada Ọ bụ ụmụwanyị niile a mụrụ n'obodo na-emebe otu ụmụada Ndị Igbo na-ahụta ọnwụ mmadụ dịka mmebi nke anụahụ na ọ bụghị mmebi nke mmụọ dịka ha kwenyere na mmụọ onye ahụ ga na-anọ n'etiti ha n'oge niile. Ọ bụrụ na mmadụ nwụọ, ihe dịrị ndị ezinaụlọ ya bụ ili ya nke ọma iji kwanyere onye ahụ ugwu nke ikpeazụ. Ihe mere e ji alụ nwaanyị n'ozu n'ala Igbo Kedụ ndị bụ "Ụmụada" n'ala Igbo? Nwaanyị nwụọ n'ala Igbo e nwere usoro omenala ndị a ga-agbaso iji hụ na e liri nwaanyị ahụ nke ọma ebe mkpụrụobi ya ga-ezu ike. Ụdịrị ọnwụ ọ nwụrụ ga-abụ ihe ga-egosi etu a ga-esi lie ya. Ọ bụrụ na ọ nwụrụ 'ajọnwụ' dịka etozughi oke, amụghị ụmụ, ọ nwụrụ n'ụbịam, n'ihe mberede maọbụ na aka mmadụ dị n'ọnwụ ya, dgz, a gaghị e me oke emume n'ili onye ahụ. Mana ọ bụrụ na nwaanyị ahụ nwụrụ 'ọnwụchi' dịka itozuoke nwaanyị, nwee ụmụaka, kaa nka, olili ya ga-ejupụta n'oriri, ọṅụṅụ nakwa nkwari. Akụkọ a ga-eleba anya n'usoro e ji eli nwaanyị tozuruoke ( lụrụ di, mụọ ụmụ, kaa nka) tupu oge ọnwụ ya. A ka na-agba mkpe n'ala Igbo etu ọ dị na mbụ? A bịa n'ala Igbo a na-ahụ nwaanyị lụrụ di dịka onye nwere ezinaụlọ maọbụ obodo abụọ; obodo ebe a mụrụ ya na obodo ebe a lụrụ ya. BBC Igbo tulere usoro dị iche iche e ji eli nwaanyị n'ụfọdụ steeti ndị mejupụtara ala Igbo nke gụnyere Abia, Anambra, Imo, Enugwu na Ebonyi. Abia Steeti Otu onye ọdịnala bụ Maazị Kalu Okorie Uzu kọwara na ọ bụrụ na nwaanyị nwụọ, na ihe mbụ ezinaụlọ ebe a lụrụ ya (ụmụ ya na di ya) ga-eme bụ ị ga gwa ezinaụlọ ebe a mụrụ ya na nwa ha nwaanyị anwụọla. Ha ga-eji mmanya, ọji na ihe ndị ọzọ gaa mee ka ndị ọgọ ha mara. Dịka ha mechara nke a, ezinaụlọ ebe a lụrụ ya ga-anọkọ kpaa maka mgbe a ga-eli ya. Ọ bụrụ na ha kpebie oge a ga-eli nwaanyị ahụ, ha ga-alaghachị n'ezinaụlọ a mụrụ ya ma mee ka ha mata maka ụbọchị ahụ. Ezinaụlọ ebe a mụrụ nwaanyị ahụ ga-agụpụta ihe niile ha chọrọ ka ndị ọgọ ha nye ha , nke gụnyere mmanya, ọjị, nri, ụfọdụ na-asi ka e gbuoro ha ewu, atụrụ, ehi nakwa ihe ndị ọzọ. N'ọge olili ya, ezinaụlọ ebe a mụrụ ya ga-eji onyinye dị iche iche ha ji 'akwa ozu' nwa ha nwaanyị gaa n'ebe ndị ọgọ ha maka olili nwaanyị ahụ. Anambra Nwaanyị nwụọ, ndị ezinaụlọ a lụrụ (ụmụ ya na di ya) ga-eji mmanya, ọji gaa mee ka ndị mụrụ ya mara. Ihe mbụ ndị mụrụ ya na-eme dịka ha nụrụ ozi ọnwụ ya bụ na onyeisi ezinaụlọ ga-egbu ọkụkọ ma tụọ aja tupu ha gawa ịhụ ozu nwa ha nwaanyị. Dịka ha hụchara ozu nwaanyị ahụ, ha ga-agwa ndị lụrụ ihe ole na ole a chọrọ n'aka ha, gụnyere ewu, ọkụkọ, akwa, nzụ, nakwa mmanụ otite. Ọ bụrụ na oge ili nwaanyị ahụ ruo ezinaụlọ mụrụ ya ga-atụkwa aja n'isi tupu ndị lụrụ elie ya dịka omenala ha si dị. Ebonyi Steeti Ọ bụ ụmụwanyị niile a mụrụ n'obodo na-emebe otu ụmụada Odoziakụ Mercy Egwu sị na nwaanyị nwụọ, na ụmụ ya ga-eji mmanya na ọjị ga mee ka ndị ikwu ya mara na nwa ha nwaanyị anwụọla. Ndị ikwunne ha ahụ ga-abịara ụmụ nwaanyị ahụ mgbaru ma soro ha rie uju maka ọnwụ nne ya bụ nwa ha nwaanyị. Ezinaụlọ abụọ ndị a ga-abịa dorita isi iji ịmata ụbọchị ụmụ nwaanyị ahụ ga-achọ ili ya. N'ụbọchị olili nwaanyị ahụ, ụmụ ya nwereike iji ehi, ewu maọbụ ọkụkọ nye ndị ikwunne ha ebe ndị ikwunne ha ga-enyekwa ha onyinye dịka nri, ọjị, mmanya n'ịbịara ha olili nne ha. A gaghị edosa ozu nwaanyị ahụ n'ihu ama (ogo), a gaghị esi n'ihu ezi kama a ga-esi n'azụ ụlọ buba ya n'ime ụlọ. Enugwu Steeti Nwaada Blessing Ada Ifeanyi sị na ọ bụrụ na Nwaanyị ọkachasị onye bụ Ada nwụọ na ụmụaka ya ga-eji mmanya, ọjị na ihe ndị ọzọ gaa ebe a mụrụ nwaanyị iji mee ka ha mara na ọ nwụọla. Dịka ha mere nke a, ndị ikwu nne ga-ekunye ha mmiri ọṅụṅụ iji gosi nnabata ozi ahụ nakwa inye ụmụaka ya ikike iri nri n'ụlọ ebe a mụrụ nne ha. A bịa n'ihiwe ụbọchị a ga-eli nwaanyị, ọ bụ ezinaụlọ mụrụ nakwa ezinaụlọ ebe a lụrụ ga-anọkọ iji hiwe mgbe ga-amasị ha ili nwaanyị a. Ọ sị na ọ bụrụ na e soghi usoro ndị a, na mmụọ nwaanyị ahụ ga-aga n'akpa ike dị egwu n'ezinaụlọ ebe a mụrụ ya. N'oge olili ya, ndị mụrụ ga-azụta akwa, ọjị, mmanya dgz gaa ịkwa ozu nwa ha nwaanyị n'ebe a lụrụ ya nke a kpọrọ 'ụlọakwa'. Ezinaụlọ ebe a lụrụ nwaanyị ahụ ga-anabata onyinye ndị si n'aka ndị ọgọ ha ma nyeghachị ha, tinyekwara ihe ọzọ a ga-achọ n'aka ha. Imo Steeti Dịka oriakụ Margaret Okere sị kọwaa, ọ bụrụ na nwaanyị tozuruoke nọrọ n'ụte ọrịa, ụmụ ya ga-aga mee ka ndị mụrụ ya mara na ahụ esighi ya ike. Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ nwụọ, ụmụ ya ga-alaghachị ga gwa ha na ọrịa ahụ na-arịasi nne ha ike. Ezinaụlọ mụrụ nwaanyị ahụ ga-abịa hụ ozu ya tupu etinye ya n'ime njụ oyi. Ọ bụrụ na oge e ji eli ya ruo, ụmụ ya ga-aga kwa gwa ndị ikwunne ha na ha chọrọ ili nwaanyị ahụ. Ndị ikwu nwaanyị ahụ ga-agụpụta ihe ndị ha chọrọ ka ụmụ ya mere ha nke gụnyere anụ ehi a manyere akwa 'George', ọjị, mmanya dgz. (Ịkwa ngwa ozu). N'oge olili nwaanyị ahụ, anụ ọbụla ụmụ ya gburu e ji eli ya, ha ga-enye ndị ikwunne ha akụkụ anụ ahụ ruru ala. Ihe gbapụtara ihe n'usoro niile a Usoro ndị Igbo ji eli nwaanyị bụ na Ndị lụrụ ya ga-ebu ụzọ mee ka ndị mụrụ ya mara na ọ nwụọla. Mgbe ụfọdụ akụkọ ọnwụ nwaanyị tozuruoke na-abụ ihe ọṅụ nye ezinaụlọ ya dịka a ga-enwe oriri na nkwari dị iche iche n'emume olili ya. Ụdị emume a na-eme gụnyere igbu ehi, ewu, ọkụkọ, mmanya, nri nakwa ihe ndị ọzọ na abụ etu aka si hara ezinaụlọ nwaanyị ahụ.
[ "Naijiria", "Abia Steeti", "Enugu Steeti", "Omenala", "Ikike ụmụnwanyị", "Anambra Steeti", "Ebonyi Steeti", "Ụmụnyanyị", "Imo steeti", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50450368
Super Eagles sị ka ha foo Agụiyi ndị Lesotho ajị
Super eagles nke Naịjirịa ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ gbarie Agụiyi nke Lesotho anya n'asọmpi itozuoke Iko Mba Afrịka 2021.
2019-11-17T18:46:15Z
Nigeria vs Lesotho: Super Eagles sị ka ha foo Agụiyi ndị Lesotho ajị
Victor Osimhen nyere goolu abụọ Super Eagles nke Naịjirịa pịara Aguiyi ndị Lesotho ụtalị ka ụmụaka mgbe ha zutere n'asọmpi itozuoke Iko Mba Afrịka nke afọ 2021. N'agbanyeghi na Aguiyi Lesotho bu ụzọ taa Naịjirịa arụ sịte na goolu Masoabi Nkoto nyere na nkeji 11. Ugo Nigeria atụgbuola ọsa Benin Republic Ihe bụ iwe ndị mmadụ ka à gbachara egwuregwu Naịjirịa na Benin Super Eagles tetara n'ụra mgbe Alex Iwobi sara goolu ahụ na nkeji 26. Tupu Lesotho amara ihe na-eme Naịjirịa malitere pịawa ha ụtalị na nkeji 28, mgbe Samuel Chukwueze nyere goolu ọzọ. Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, Victor Osimhen zakwara aha na goolu abụọ ndị o nyere na nkeji 75 na 85. Dịka ọ fọrọ tịkọm tịkọm ole ka e gbuchie bọọlụ, Chidozie Awaziem kpọrọ ụkwụ ọcha wụnye goolu na neetị ndị Naịjirịa. N'ikpeazụ Naịjirịa ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ merie Lesotho. Ọkparaeze Andrew agọrọla aka ya Okparaeze Andrew bụ nwa atọ nke ezenwaanyị Elizabeth mba Briten ekwuola na o nweghi ncheta maka ịwakpo otu nwaanyị onye mba Amerịka. Nwaanyị ahụ enyere aha ya dịka Virginia Guiffre boro ọkparaeze Andrew na ọ wakporo ya mgbe ọ dị afọ iri na asaa. Lee ihe mere n'agbamakwụkwọ Harry na Meghan Markle Ọ bụ nwa nwoke! Mgbe BBC gbara ya ajụjụ ọnụ, Andrew kọwara na ụbọchị nwaanyị ahụ kwuru na ọ wakporo ya, na ya na ezinaụlọ ya nọ na be ya na-ezuike. O kọwara na o nweghi eziokwu dị n'akụkọ nwaanyị ahụ na-akọ maka mwakpo. Gọvanọ ọhụrụ abụọ ga-apụta taa Taa bụ ụbọchị Inec ga-agụpụta mpụtara ntụliaka ọkwa gọvanọ emere na steeti Kogi na Bayelsa. Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Festus Okoye ekwuola na ntuliaka ụbọchị satode gara ọfụma nakwa na ọgbaghara dara n'agbanyeghi ihe niile ha nwara. Okoye kwukwara na enwereike ịkagbu mpụtara vootu n'ebe enwere akụkọ ịzụ igbe vootu nakwa ịchụsasị ndị mmadụ. Gwunye nu na BBC Igbo iji nụ akụkọ ndị ka o si dị ọkụ. A kụpụla Federer na ATP Stefano Tsitsipas akụpụla Roger Federer n'ihe ịtụ anya n'asọmpị ATP nke na-aga ugbua na mba Briten. Nke a pụtara na Tsitsipas ga-ezute Dominic Thiem n'asọmpị ikpeazụ nke ATP. Ihe onyonyo ga-amasị gị Gee nkeji ebe a
[ "United Kingdom", "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Bọọlụ", "Kogi steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50415969
Etu mmadụ 21 na-egwu coal n'Iva Valley dị n'Enugu si nwụọ afọ 70 gara aga
Ndị uweojii gbagburu ndịọrụ 21 bụ ndị na-eme ngagharịiwe maka ụgwọ e ji ha.
2019-11-18T05:44:20Z
Iva Valley Massacre: Ihe mere ndị na-egwu coal n'Enugu afọ 70 gara aga
Sculpture depicting the Iva Valley Massacre Abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ọbụla bụ ụbọchị ncheta ogbugbu e gburu ndịọrụ 'coal' n'Enugwu. Lee ihe akụ ọnatarachi jupụtara n'Enugu State Ya bụ ihe mere n'afọ 1949. Afọ a mere ya afọ iri asaa o ji mee. 'Iva Valley Massacre'? Nwaeze mba Ingland Philip, mgbe ọ bịara njem nleta n'Iva Valley na Febụwarị 1956. N'oge ndị ọcha mba Briten na-achị Naịjirịa, 'Coal' so n'otu ihe na-enye Naịjirịa nnukwu ego. Otu n'ime ebe a na-egwupụta coal n'Enugu oge ahụ bụ ebe a kpọrọ 'Iva Mines'. Na Nọvemba 1, 1949, ndịọrụ gbara abụbụ ọrụ n'ihi ụgwọ ndị ọcha ji ha. Kama ịkwụ ha ụgwọ ha, ndị ọcha nyere iwu ka e wepu ogbunigwe niile e ji arụ ọrụ ngwupụta coal na 'Iva Valley'. Ndịọrụ ngwupụta 'coal' na Iva Valley Mana ndịọrụ ahụ ekweghị ka e wepụ ihe ndị ahụ. Ha ma na ndị ọcha ga-emechi ebe ahụ ma ha wepụchaa ogbunigwe ndị ahụ. Mgbe nke a na-eme, onyeisi ndị uweojii aha ya bụ F.S Philip nyere ndị otu ya iwu ka ha were egbe chụsasịa ndịọrụ ahụ. Ndịọrụ mmadụ iri abụọ na otu nakwa otu onye na-agara onwe ya nwụrụ na ya bụ ọgbaaghara. Ndị nwụrụ n'Ịva Valley Aha ụfọdụ ndịọrụ 'coal' nwụrụ na Iva Valley Aha ndịọrụ e gburu na ọgbaaghara 'Iva Valley' ka dị ruo taa. Otu a kpọrọ 'Centre for Memories' nke dị n'Enugwu nyere BBC Igbo ụfọdụ aha ndị a. Ha gunyere: Sunday Anyasodo, Livinus Okechukwuma, William Nwehu, Felix Nnaji, Ogbania Chime na Moses Ikegbu. Ndị ọzọ bụ Okafor Ageni, Augustine Nwokoma, Onoh Onyia, James Ekeowa, Nwachukwu Ugwu, Ngwu Nwafor, Jonathan Ezeani, dgz. Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ikike dịịrị onye kwenyere na ọnwụ ndịọrụ 'coal' na Iva Valley bụ ihe nlegara anya nye ndị otu ndịọrụ niile. Akụkọ ga-amasị gị: Lee ihe akụ ọnatarachi jupụtara n'Enugu State "Naịjirịa na Amerịka dịka ndị dinta na-achụ otu anụ" - Trump Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Akụkọ mgbe gboo", "International Labour Organization", "Enugu Steeti", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50450802
Ibu ọnụ ruo abalị 40 ọ na-egbu mmadụ?
Kamgbe akụkọ a ka na-enyocha nyocha pụtachara na otu nwoke nwụrụ ebe ọ na-ebu ọnụ , BBC Igbo na-ewetere ụnụ ụfọdụ usoro ị ga-eso ma buwe ọnụ ka ịghara imerụ onwe gị ahụ.
2019-11-18T15:18:09Z
Fasting: Ibu ọnụ ruo abalị 40 ọ na-egbu mmadụ?
Onye na-ekpe ekepere Ụfọdụ na-ebu ọnụ otu ọnwa maọbụ karịa Ibu ọnụ na-abụkarị atụmaatụ ndị okpukpere dị iche iche ji akwado ekpere ha. Mana ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na o nwere ụdịrị ibu ọnụ ga-abụ mmadụ mee, o butere onwe ya nsogbu. Kpeerenu Nigeria ekpere ma buoro ya ọnụ - CAN 'Anyị biacha ekpere onye ọgwụgwọ nsọ edina anyị'-Ụmụnwaanyị 9 Ụkọchụkwụ Paul Chikwem bụ onyeisi n'ụlọụka Christian Pencticostal Church dị na Festac kwuru na ibu ọnụ dị mma maka onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraist. O kwuru na ibu ọnụ dị n'ụdị n'ụdị dịka nke gụnyere isi n'ụtụtụ ruo na mgbede, iṅụ sọ mmiri , iri sọ ụfọdụ nri nakwa etu ọbụla onye na-achị ya si kpata. Mana ọ dụrụ ọdụ sị na ibu ọnụ karịghala nke a ga-ebi ụbọchị ahụ maọbụ gụnye erighị aṅụghị ma ncha ruo ihe gafere ụbọchị iri abụọ na otu, e kwesiri ịkwadoro ya ọfụma site n'ime ihe ndị a. Inyocha ahụ gị n'aka dọkịta ga-agwa gị ma ị ga-emeli ya. Ị nọ n'otu ebe ịgaghị na-arụ ọrụ maọbụ na-agbakasị ahụ Marakwa maọbụ Chukwu si gị mee ya Emeela ya ka iwee maa aka Kebie ya ekebi Akụkọ ga-amasị gị Ihe mere ndị na-egwu coal n'Iva Valley dị n'Enugu afọ 70 gara aga 'Obi dị anyị ụtọ na-atọghapụrụ Fr. Theophilus' Ugo Nigeria atụgbuola ọsa Benin Republic Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Omume", "Naijiria", "Ndị otu Kristi", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50457347
Tottenham esepụla Mauricio Pochettino oche n'otele
Akụkọ ọchụchụ ya pụtara ihe n'abalị Nọvemba 19 2019, mgbe ha Tottenham tinyere yan'elu akara Twitter ha.
2019-11-19T20:08:11Z
Mauricio Pochettino: Tottenham esepụla ya oche n'otele
Pochettino Pochettino nọrọ afọ ise dịka onye nchịkọta/nkuzi Tottenham Akụkọ mere ugbua na-akọwa na Tottenham ejiri azịza zapụ Mauricio Pochettino chịkọtara ha afọ ise. Arsenal achụọla Emery ọsọ mgbada Uefa Champions League: Ndị ga-ezute ibe Ihe mere n'etiti Tottenham na Juventus N'okwu ha depụtara iji gbasaa ozi ọchụchụ ya, Daniel Levy bụ onyeisioche klọb ahụ kwuru sị "ọ rara anyị ahụ ime mgbanwe a. "Ọ bụghị mkpebi anyị mere n'ọkụ ọkụ, kama ụdịrị ihe anyị gbatara na League na ngwụcha afọ gara aga na nke anyị na-agbata na mbido afọ ọhụrụ a agaghị ka anyị si chọọ". EFCC na-enyo etu nwoke nọ na mkpọrọ si gwunwuo mmadụ nde dọla Otu nwoke nọ nga n'afọ 24 n'ụlọmkpọrọ Kirikiri dị na Legọs maka iji intanet gwuo chamdum anọrọla ebe ahụ mee nke ka nke. EFCC chọpụtara na Hope Olusegun Aroke menwụrụ nke a n'ihi na o nwere ohere ịnwe ekwenti na ịntanet nke onye nọ na mkpọrọ ekwesịghị inwe. Gịnị ka Uche Nwosu ga-eme ugbua? Nke na-akpọtụ ugbua bụ na ụlọikpe mkpegharị n'Abuja akụchapụla akwụkwọ Uche Nwosu nke Action Alliance gbara Emeka Ihedioha nke PDP maka mpụtara ntuliaka ha mere na Febuary. Uche Nwosu na Emeka Ihedioha chịpụrụ ya na ntụlịaka nke gọvanọ n'Imo steeti bụ nke Inec nyere Ihedioha mmeri. Nke a na-eme dịka akwụkwọ Ararume na Uzodinma gbara Ihedioha dara mmiri. Ndị ọkaikpe mmadụ ise nke Jọstis Justice Oyebisi Omoyele nọ n'isi ya kpebiri ya bụ ikpe. Ndị a nille sị na Ihedioha enwetazughị vootu ikpo abụọ n'ụzọ atọ a chọrọ na steeti ahụ maka onye ga-abụ gọvanọ steeti ahụ. Nwosu, Ararume na Uzodinma rịọrọ ụlọikpe ka e wezụga mkpebi ụlọikpe ntụliaka bụ nke sị na Ihedioha meriri na ya bụ ntuliaka e mere n'ọnwa Maachị nke afọ 2019. Ọzọ mere taa bụ na ụlọikpe ukwu n'Ikeja kpụpụtara Ogunyemi Olalekan ka ọ bịa zara ọnụ ya. Olalekan bụ onye uweojii ahụ a sị gbagburu nwokorobịa aha ya bụ Johnson Kolade na ọnwa maachị afọ a ebe ha na-ekiri bọọlụ na Mangoro, Legọs. Okpunnabụenyị adọkaala N'ofesi, ụzụ atụọla ka a chọpụtara na ụfọdụ okpunnabụenyi ndị otu na-abụghị nke gọọmenti a kpọrọ Marie Stopes kere na Uganda nwere oghere maọbụ nwee ike ịgbawa dịka ngalaba na-ahazi ọgwụ sị gbaa n'ama. Otu egwuregwu Edo erie ka bọsụ N'egwuregwu, Edo steeti akpụọla otu egwuregwu ụmụnwaanyị ha isi akpụrụ Albertị. Gọọmenti steeti ahụ ekwetala na ha ga-ebido ịkwụ ụmụnwaanyị ahụ ụgwọ, dịka akwụrụ otu egwubọọlụ ụmụnwoke Bendel Insurance. Gee akụkọ ndị n'otu nkeji Ọkụ gbagburu otu ezinaụlọ gụnyere mmadụ anọ n'ime abali Blessing Okafor hapụụ ụmụ ya atọ n'ime 'Container' gawa mkpa ya oge ọkụ gbara Ụzụ akwa na-atụ na Benue steeti ebe nwoke mmadụ aha ya bụ Seker Akaa, bụ onye odeeakwụkwọ ebighebi n'ụlọọrụ gọomentị, so nwunye ya bu afọ ime nakwa ụmụ ya abụọ were nwụọ n'ọkụ ahụ. Ọkụ agbagbuola Fada ụka Katọlik, a tọrọ ọzọ Ndị ụweojii kwetara na otu ezianụlọ gụnyere mmadụ anọ nwụrụ n'ọkụ ọgbụgba ebe ndị agbatobi kwuru na ndị ahụ ahụghị ụzọ ha ga-esi gbalahụ ọkụ ahụ mgbe ha tetara. Ndọrọndọrọ ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari agwaala ndị otu PDP na ndị ọzọ ha gbara gawa ụlọikpe maọbụrụ na mpụtara ntuliaka e mere na Kogi nakwa Bayelsa steeti edoghi ha anya. O kwuru nke a dịka Inec weliri aka Yahaya Bello dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi steeti. N'egwuregwu, Otu na-achịkọta ndị egwuregwu n'ụwa niile edegarala minista na-ahụ maka egwuregwu na Naịjirịa akwụkwọ ozi ịkweta na ha enwetala dọlla otu narị puku na iri atọ bụ ụgwọ ha kwufere Naịjirịa mbụ. Gee Nkeji ebe a
[ "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50445943
Ihe ise ị ga-emenwuru ụmụnwoke nọ na ndụ gị
Dịka e kewapụtara ụbọchị Novemba 19 dịka nke e ji akwanyere ụmụnwoke ugwu kwa afọ, lee ihe ndị ị ga-emenwuru ha.
2019-11-20T04:25:51Z
International Men's Day: Ihe ise ị ga-emenwuru ụmụnwoke nọ na ndụ gị
Ụmụnwoke na-enwe aṅụrị Ị ma ihe ndị ị ga-emenwuru nna, di, enyi nwoke, deede maọbụ enyi gị nwoke taa? BBC Igbo chọrọ inyere gị aka gwa gị ihe ndị ị ga-ejinwu mee ha obi aṅụrị n'ọdịniihu. 'Ụmụnwoke, sepụnụ ọnụ n'ara ụmụnwaanyị' Ọtaakụ, lee ego ole ị sụpịara n'ọnụ n'afọ iri Ihe mere ụfọdụ ụmụnwoke ji 'alụ' nwabebi Ọtụtụ oge ka ụmụnwoke na-ekwu sị "oge niile ka ọ bụ ụmụnwaanyị ka a na-akwanyere ugwu. Gịnịkwanụ ka a na-emere ụmụnwoke iche?" Nke a mere e ji kewapụtazie ụbọchị Novemba 19 dịka nke e ji akwanyere ụmụnwoke ugwu kwa afọ. Ọ bụrụ na ị mabughi ihe ị ga-emenwuru nwoke ahụ nọ na ndụ gị, lee ọmụmaatụ: 1) Kwụọrọ ya ụgwọ nri: Kpọrọ nna gị, di gị, enyi gị nwoke, nwanne gị nwoke maọbụ deede gị gaa ebe a na-ere nri nke Bekee kpọrọ "fast food joint/restaurant", zụọrọ ya nri ma kwụọ ụgwọ ya. Makana ụfọdụ oge ka ụmụnwoke na-ekwukarị na oge ọbụla naanị ha na-azụrụ ụmụnwaanyị ihe, mana ị kwụọ ụgwọ nri ahụ, ọ ga-atụ ya n'anya. Ọ bụrụ na ị chọghị ịkpọ ya aga ebe ị ga-azụta nri, zụta ngwanri ị ga-eji esiri ya nri ọ kacha hụ n'anya. 2) Were 'ihe nsori' merụọ ya ahụ: Nke a bụkwa naanị maka ndị lụrụla di oo ;-) Iji sị ya na ọ gbalịala ma sị ya na ihe ọ na-eme na-amasị gị kwa mgbe, nabata ya ma ọ lọta ma gosi ya na ị chere ya eche. Gaa n'ihu nye ya n'ụdị ị na-enyetubeghi ya mbụ, nke ga-eme ka ọ ghara ichefu ụbọchị a echefu. 3) Tinye ego n'akpa ha: Ma ị na-arụ ọrụ ma ị naghị arụ, chọọrọ ya nwaobere ihe, nke ga-eme ya obi aṅụrị. Sị ya "mpa m; di m; enyi m nwoke; nwanne m nwoke; deede m; ngwa were nke a tinye mmanụ n'ụgbọala gị, were nke a tinye ego n'ekwentị gị maọbụ were nke a gbaa ụgbọala ruo ebe ị na-aga". Ọ gaghị echefu ụbọchị a echefu ma ị mee ya, makana ọ ga-abịa dịka ihe ọ na-atụwaghị anya. 4) Deere ya akwụkwọ ozi: Nke a abụghị iji zie ya ozi mgbakasị ahụ, kama ọ bụ ebe ị ga-agwa ya ihe niile ọ na-emeta ebe ị nọ. Gwa ya ihe ndị ọ na-eme na-amasị gị na etu o si eme ka ndụ tọọ gị ụtọ. Gwa ya na ị hụrụ ya n'anya, na ọ bụghị itu ọnụ. 5) Nye ya oghere: Anyị asịghịkwa gị kwapụrụ ya n'ụlọ oo. Ihe anyị na-ekwu bụ gị nye ya oghere ka ya na ndị enyi ya nọkọọ ma nwee aṅụrị. Ọ bụrụ na ị na-eleburu ya elekere ma ọ pụọ apụ (ya bụ na ị na-enyo ma ọ lọtara n'oge maọbụ ọ lọtaghị), hapụrụ ya ka ya na ụmụnwoke ibe ya mee naanị ụdịrị ihe na-amasị ha. Ị hụlanụ na ihe ise ndị a agaghị efu gị oke ego, mana ọ ga-eme ka nwoke ahụ nọ na ndụ gị ghọta na ị hụrụ ya n'anya. Akụkọ ga-amasị gị: EFCC na-enyo etu nwoke nọ na mkpọrọ si gwunwuo mmadụ nde dọla World Toilet Day: Iji mmiri maọbụ iji ihe hịcha otele gị bụ ajụjụ ụwa kpụ n'ọnụ Ihe na-akpọga ndị Naịjirịa Dubai Paul na Peter Okoye na ụmụnne ndị ọzọ na-eme otu ihe mana ha anọkọghị ọnụ Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Omume", "Okike", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-45205286
Tupu i gbanye igwe i ji amụ ọkụ, lee etu ị ga-esi chekwaa onwe gị
Gaasị si n'igwe na-enye ọkụ latrik egbuola ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa.
2019-11-20T18:39:17Z
Carbon Monoxide: Tupu i gbanye igwe i ji amụ ọkụ, lee etu ị ga-esi chekwaa onwe gị
Generator Ọtụtụ ndị mmadụ na-amụkarị igwe na-enye ọkụ maka na ọkụ anaghị adịkebe na Naịjirịa Kwa ụbọchị ka akụkọ na-apụta etu gaasị Bekee kpọrọ "Carbon Monoxide" si egbu ndị mmadụ n'ụra. Gaasị a na-esi n'igwe na-enye ọkụ enweghị usi nke o ji enwe agwa "color", nke mere na ị nwereike ikuru ya na-amaghị ama. Portharcourt: Anwụrụọkụ ojii ekogbuola anyị Ikuku ọjọọ ndị nwere ike ibute ọnwụ Etu anwụrụ igwe na-enye ọkụ siri gbuo mmadụ isii gara ịgbankwu n'Imo - Ndị uweojii BBC Igbo kpọrọ Dọkịta McGinger Ibeneme, onye kwuru na ọ bụ ikuru ọtụtụ 'Carbon Monoxide' a ga-egbunwu mmadụ. O kwukwara na ihe kacha ebute ya bụ nsogbu bụ mmadụ ịnọ ebe ikuku anaghị esinwu apụ, nke bụ na gaasị ọjọọ a bata n'ebe ị nọ, ma ọ hụghị ụzọ ọ ga-esi pụọ, ọ bụrụ nsogbu nye onye na-ekuru ya. BBC Igbo gbara onye ọrụ nchekwa ajụjụọnụ maka egwu dị n'iji igwe ọkụ na-amụ ọkụ nakwa nchekwa dị mkpa maka ya. Dibia Bekee Chuka Agunwa gwara BBC Igbo na egwu dị icheiche dị n'iji igwe ọkụ mụọ ọkụ ọkachasị egwu ọkụ ọgbụgba nakwa egwu anwụrụ ikwugbu mmadụ. Nchekwa megide igwe na-enye ọkụ Agbanyela igwe ọkụ n'ime ụlọ, n'akụ ụlọ, maọbụ n'isi mpio maọbụ ebe ndị mmadụ na-anọpụga anọpụ - Dibia Bekee Agunwa kwuru na igwe ahụ na-ewepụta ajọ ikuku anaghi enwe ishi ọbụla nke a na-akpọ 'Carbon Monoxide' na Bekee nke na abanye mmadụ n'ahụ ma nochie ezigbo ikuku dị mmadụ n'ahụ. Ya mere na mmadụ kwesiri idobe igwe ahụ ebe dị na mbara ebe anwụrụ ya agaghị enwe ohere ọbụla ịba n'ime ụlọ ebe mmadụ nọ Ekwela ka mmiri na-ama igwe na-enye ọkụ gị - Igwe ahụ na-enye ọkụ na-ebu ọkụ latric aba n'ime ụlọ mana ọkụ latric na mmiri anaghị agakọ. Mmiri mesa waya ọbụla ọkụ si apụ n'igwe na-enye ọkụ ahụ o nwere ike ịdọgbu mmadụ. Rụọrọ igwe na-enye ọkụ gị ihe mkpuchi maọbụ ụlọ ebe agaghị ekwe ka mmiri maa ya. Ejila ekwenti gaa ebe igwe na-enye ọkụ nọ - ọtụtụ ndị mmadụ na-eji ekwenti ha agba ọkụ ma ha chọrọ ịgbanye igwe na-enye ọkụ ha mana dọkịnta Agunwa kwuru na nke a bụ ihe jọgburu udele sigbuo nkakwụ maka na ekwenti nwere ikike na-enye ọkụ nke anaghị ahụ anya si ikuku nke nwere ike ime na igwe ọkụ ahụ ga-agbawali ma ekwentị dị n'akụkụ ya. Kwụsị ịgbanye mmanụ ma ọ na-asụ - Mmanụ ọkụ igwe ahụ na-eji enye ọkụ bụ nke na-agba ọkụ ọsịsọ ma ọ bụrụ na igwe ahụ na-asụ ị na-agbanye mmanụ, o nwere ịgba ọkụ. Ọtụtụ mmadụ anwụọla maka ihe a Mmadụ ise si n'otu ezinaụlọ dị mmadụ isii n'obodo Igboetche dị n'okpuru ọchịchị Etche dị na Rivas steeti anwụọla site n'anwụrụ ọkụ. Ụdị anwụrụ gburu ezinaụlọ ahụ bụ nke si n'igwe na-enye ọkụ nke a na-akpọ 'Genereator' na Bekee. Ndị nwụrụ n'ime ezinaụlọ ahụ bụ nne bụ Onyinye Monye, nna bụ Andrew Monye na ụmụaka atọ n'ime anọ. Akụkọ kwuru na ezinaụlọ ahụ gbanyere igwe ahụ na-enye ọkụ ahụ dobe ya n'ime ụlọ ebe ha na-asa ahụ were labaa ụra. Mana ndị ọrụ nchekwa na ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru na anwụrụ si n'igwe ahụ enweghị ebe o si apụ, kama ọ bara n'ime ụlọ niile wee tọgbuo mmadụ ise ahụ n'ụra. Naanị otu onye ka a gbapụtara n'ime ha bụ otu nwa ha dị afọ 13 bụ onye e bugara ụlọọgwụ mana ụmụnne ya ndị ọzọ dị afọ 15 na afọ 11 nwụrụ n'ụra ha. Otu onye obodo ahụ kwuru n'igwe ahụ na anọbu na mbara mana ọ bụ ohi e bidoro na-ezu n'akụkụ ebe ahụ mere ha ji bubaa ya n'ime ụlọ. Akụkọ kachasị n'abalị a: Ụkọ mmanụ ebidola n'Anambra Ụmụ Naịjirịa na-eti mkpu maka ụkọ mmanụ ụgbọala Mana ụfọdụ ndị ezinaụlọ ahụ ekwetaghị n'ihe a mere, kama, ha na-ekwu na ọ bụ nshi ka e nyere ụmụnne ha. Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni kwuru n'ezie n'ihe a mere, ebe e bugara ozu mmadụ ise ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu. O kwukwara na ha na-eme nyocha banyere ihe ahụ mere. Ọtụtụ ezinaụlọ na-eji igwe na-enye ọkụ amụ ọkụ na naịjirịa nke mere na ọ dị mkpa ka onye ọbụla mara nchekwa dị icheiche igbochi ọkụ maọbụ anwụrụ si na igwe ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị Akụkọ kachasị n'abalị a: Ụkọ mmanụ ebidola n'Anambra 2019 Election: Lee ndị dị afọ 18-40 chọrọ ịnọchite ndị Ebonyi steeti SARS: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mwogharị ha Victor Moses eyipụla uwe o ji agbara Naijiria bọọlụ
[ "Naijiria", "Riva steeti", "Ike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50499851
Ọ bụ ndị na-azọ onyeisi ọdọụgbọala bara onwe ha ọgụ n'Ebonyi - Uweojii
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi Steeti bụ Loveth Odah sị na ọ bụghị ndị nkwado APC na PDP lụrụ ọgụ na steti ahụ.
2019-11-21T10:20:30Z
Ọ bụ ndị na-azọ onyeisi ọdọụgbọala bara onwe ha ọgụ n'Ebonyi - Uweojii
Ụmụakwụkwọ bu okwute na-eme ngagharịiwe Loveth Oda bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'ebonyi steeti a katọọla akụkọ kwuru na ndị APC na PDP lụrụ ọgụ n'obodo Agubia dị n'Ikwo. Kama na ọ bụ ndị na-azọ onye ga-abụ onyeisioche ọdọụgbọala dị n'obodo ahụ malitere ịlụ ọgụ n'etiti ha. Naanị otu onye ka e gburu n'ọgụ ndị otu nzuzo n' Ebonyi - Ndị uweojii Etụ ịkwụ ụgwọ ụtụisi siri kpata mmechi ahia Abakpa dị n'Abakiliki Ọ gwara BBC Igbo na nke a na-abịa dịka onye jibu ọkwa ahụ gbara arụkwaghịm n'ọrụ, a na-achọzi onye ga-anọchi anya ya. Ya mere onyeisioche okpuruọchịchị Ikwo họpụtara ndị ga-anọchitu ọkwa a nwa oge nta mana ụfọdụ ndị ntoroọbịa jụrụ ma họpụta ndị nke ha. Onye mụnyere ọkụ gbara n'Ebonyi? Nke a butere ọ gbaghaara n'etiti ha, ịlụ ọgụ nakwa ịkpọ ụlọ na ụgbọala a ọkụ. Odah sị e merụrụ ọtụtụ ndị ahụ mana o nweghi onye nwụrụ, gbaa ụfọdụ ụgbọala na ụlọ obibi ọkụ. Odah sị dịka ọ dị ugbua na ndị uweojii anwụchiela ụfọdụ ndị so mee nke a ma weta udo n'obodo ahụ. Mana otu onye a kpọrọ gwara BBC Igbo n'ezie na ọ bụ esemokwu onye ga-abụ onyeisioche ọdọụgbọala butere nke ahụ. O kwuru na ọ bụ otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị chọrọ itinye ndị nakwa n'isi ọdọụgbọala ahụ. BBC Igbo gbara mbọ inwete ndị isi otu PDP na APC ịmata uche n'okwu a mana o nwebeghi isi.
[ "Naijiria", "Ebonyi Steeti", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50499592
Ebe ụmụakwụkwọ abụọ mahadum Babcock siri 'daa iwu'
Mahadum Babcock so n'ime mahadum kachasị mgbagote elu na Naịjirịa kemgbe ọ pụtara n'afọ 1999.
2019-11-21T12:01:56Z
Babcock sex video: Ebe ụmụakwụkwọ abụọ mahadum Babcock siri 'daa iwu'
Babcook University N'ụbọchị Wenesde ka mahadum a chụpụrụ otu nwata akwụkwọ ha pụtara na otu ihe nkiri ebe ha na-akwa iko nke na-ewu na sochal midia. N'ime akwụkwọ mgbasaozi mahadum a zitere BBC, site n'aka ọnụ na-ekwuru ha bụ Joshua Suleiman sị na ihe a mere kamgbe ọnwa Epụrel. O kwukwara na ọ bụghị n'ime ụlọakwụwkọ Babcock ka ha kwara iko a. Anwụchiela onyeisi mahadum Zimbabwe Mahadum Covenant dara iwu - ọkaiwu 'Mmiri gbagburu ụmụakwụkwọ abụọ na Mahadum anyị' "A chụrụ nwoke ahụ nọ n'ime ihe onyonyo a n'ọnwa Febụwarị nke afọ a ka e mechara nyocha chọpụta na aka ya dị n'ime ajọ agwa a kpara n'ime ụlọakwụkwọ a." Akwụkwọ mgbasa ozi ahụ kwukwara na a chụọla nwaada ahụ ya na nwoke ahụ kwara iko n'ime ihe onyonyo ahụ. Ihe gbakara ụfọdụ mmadụ isi nke mere ha jiri na-ajụ ihe kpatara nke a. Dịka o si kwụrụ ugbua, ụlọakwụkwọ a gbagidere ụkwụ n'iwu mahadum ha medidere ụdịrị agwa. Babcock bụ mahadum ụlọụka e ji Sabat mara n'ala Igbo nwe - nke pụtara "Seventh Day Adventist Church" na Bekee. Babcock university so n'ime mahadum ndị nkiti nwe na Naịjirịa malitere n'afọ 1999. Lee ihe ị kwesịrị ịma maka Mahadum Babcock Babcock University 1) Ha na-erube isi n'omume ndị Sabat na mahadum ahụ Dịka anyị ekwuola na ọ bụ ndị Sabat nwe ya bụ mahadum nke mere ha ji erube isi n'emume ụka Sabat na-amlite namgbede Fraịde rue ehihe Satọde. 2) Iwu megidere iyi aka na-amakụ ahụ Akwa ọbụla na-amakụ ahụ esoghi n'ụdịrị akwa a na-ekwe ka ụmụakwụkwọ yiri na mahadum a. Mahadum a na-akpasị onye ọbụla yi ụdịrị akwa bịa akwụkwọ ka onye chọrọ iwakpo ndị mmadu n'ike. 3) Nwoke nanwaanyị ekwesighi iso na-aga ụfọdụ ebe n'ụfọdụ oge. Mahadum a machiri ụmụnwoke na ụmụnwaanyị iso na-agagharị n'ụfọdụ ebe n'ụfọdụ oge. Ha sị na o bụ ezigbote nsogbu ma ha hụ ndị mmadụ n'ụdịrị ọnọdụ a. 4) Anaghị anabata uwe jean na trawụza "pencil" Uwe jean, bụ uwe ndị mmadụ kachasị eyi n'ụwa sokwa n'ihe a machiri na ya bụ mahadụm. Uwe ụmụnwaanyi dịka "skirt" dị n'elu ikpere so kwa n'ihe a nabataghị. trawụza agbadaghị ala nkeọma sọkwa n'ahịa iwu. 5) Adịghị eyi ọla na iyeri Iyi iyeri ntị, iyeri imi, nke ire, nke ara na iyeri ọnụ so n'ihe ha machiri. A machikwara ịkpụ ụfọdụ isi. 6) Ụmụakwụkwọ adịghi esi maọbu rie anụ Mahadum a adịghị ekwe ka esie nri n'ebe obibi ha. Ha adịghi iri anụ, ihe ha na-eri bu ihe a kpọro "tofu".
[ "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Ụmụaka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50499853
Nwaanyị esiela ma rie nwa ya
Ihe ịtụ n'anya mere na mba Tanzanịa ebe a na-enyo na aka otu nwaanyị dị n'ọnwụ nwa ya nwaanyị.
2019-11-21T18:05:28Z
Cannibalism: Nwaanyị esiela ma rie nwa ya
Nwaanyị na nwa ya Gọomentị mba Tanzania zipuru ndị isi ọrụ ha n'obodo Mavanga ebe a na-enyo na otu nwaanyị gburu, sie ma rie nwa ya. Akụkọ si mba ahụ apụta na-akọwa na anwụchiela nwaanyị ahụ na di ya maka ịgba ha ajụjụọnụ maka ihe mere nwa ha nwaanyị. Nwoke akụgbuola nwa ya n'Enugwu Nne adagbuola nwa ọhụrụ ya Aka akparala nwaanyị rere nwa ya n'Ogidi Ndị isiọrụ ahụ kwuru na ihe a mere ebe mmadụ na-eri mmadụ ibe ya, wụrụ ha akpata oyi n'ahụ makana ha anụtụbeghị ya mbụ n'obodo ha. Napụ Invictus Obi ego, Ụlọikpe gọọmentị etiti dị na Legọs enyela iwu ka e weghara ihe karịrị nde narị abụọ na iri asatọ a chọtara n'ọbaego Obinwanne Okeke a ma dịka Invictus Obi. Ọkpaikpe Rilwan Aikawa nyere iwu a ka ndị ụlọọrụ EFCC kwuru na ha hụrụ ego ndị a n'ọbaego ya na nke ụlọọrụ ndị o hibere. N'akụkọ ọzọ, Anwụchiela otu nwoke a na-enyo na ọ chọrọ ịkpa mkpamkpa n'ime ụgbọelu Ethiopian Airlines feturu na Bujumbura dị na mba Burundi. Ụgbọelu ahụ si Addis Ababa na-aga Burundi nakwa Kigali dị na mba Rwanda, oge nwoke ahụ malitere ikwu na ọ ga-eji ogbunigwe gbarie ya bụ ụgbọelu. Mourinho agwala ndị ntaakụkọ okwu Jose Mourinho ekwuola na ọ gaghị eme mmehie ndị o mere mgbe ọ na-achịkọta otu ndị ọ chịkwa buru, ugbua ọ na-achịkọta Tottenham. 'Ndị ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ karịa ndi Boko Haram' Akwụkwọ nchopụta a kpọrọ Global Terrorism Index nke 2019 kwuru na ndị ọchịehi egbukarịala mmadụ karịa Boko Haram kemgbe n'afọ 2018. Akwụkwọ a bụ nke e wepụtara na Wednezde sị na Naịjirịa bụ ndị atọ na mba ụwa ihe iyi ndụ egwu kachasị metụta kamgbe afọ 2015. Mmadụ 15 anwụọla na 'mwakpo ọchị ehi' 'Ndị ọchị ehi egbuola mmadụ 5' na Edo Dịka akwụkwọ a si kwuo na iyi ndụ egwu na Naịjirịa kachasị na nke ndị ọchịehi na ndị Boko Haram na-eme. Na ndị otu abụọ a akpaala ike iyi ndụ egwu dị pasentị 78 ebe ha gburula ihe ruru pasenti 86. Agbanyeghi na aha ndị ọchịehi a nọghị n'akwụkwọ ndị na-eyi ndụ egwu kama ogbugbu n'eso nsogbu ha na ndị ọrụ ugbo bụ ihe iyi ndụ egwu. Akụkọ a sị na ndị mmadụ nwụrụ n'afọ 2018 maka nsogbu ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo eruola 1,158. Ọ sị na nke kachasị dị njọ bụ mwakpo mere n'obodo Gwaska dị na Kaduna, n'ọnwa Mee afọ 2018. Ikpe Sanusi na Ganduje Emir Muhammadu Sanusi rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa malite n'afọ 2009 rue 2014 tupu o were ọkwa Emir Taa ka a ga-ama ma nkewa Gọvanọ Abdullahi kewara ọchịchị ọchị ọdịnala nke Kano nke obodo ahụ nwee eze ise ọ ga-akwụrụ ụlọikpe ga-etinye ọnụ ma Gọvanọ Ganduje omere ọfụma ikeri ngalaba ọchịchị Emir Sanusi ụzọ ise pụtara Rano, Kano, Karaye, Bichi na Gaya. N'ofesi Akwụsịtụla ogbugbu ndị a mara ikpe ọnwụ n'Amerịka maka ikpe sịrị na usoro e ji egbu ha megidere iwu. Otu ọkaikpe chabiri ikpe ma kwuo na akwụkwọ mmadụ anọ n'ime ndị a gbara megide usoro ogbugbu ha nwereike ịmịta mkpụrụ. Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles Mịnịsta na-ahụ maka egwuregwu bụ Sunday Dare sị n'okwu ịgbatịkwu ọnọdụ Gernot Rohr dịka onye nchịkọta Super eagles dị n'aka ndị NFF. Gernot Rohr na NFF nwere site ugbua ruo ọnwa Juun afọ 2020 inwọgharị oge ọrụ maọbụ ya akwakọrọ pụọ. Nkeji
[ "Naijiria", "Amerika", "Ọgụ ndị na-achịehi", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50513668
Ihe ị ga-eme ma ị hụ ogbunigwe n'ogbe gị
Ihe ndị i kwesịrị ime ma ị hụ ogbuniwe n'ọrụ ugbo gị, ebe ị na-arụ ụlọ maọbụ n'akụkụ ebe obibi gị.
2019-11-22T12:27:27Z
Landmines: Ihe ị ga-eme ma ị hụ ogbunigwe ọbụla n'ogbe gị
Ogbunigwe egwupụtara n'ala Ogbuniwe na ihe mgbawa dị iche iche a kpọrọ un-exploded ordinances (UXOs) bụ ezigbo nsogbu nye ọtụtụ obodo dị na mbaụwa. Nke a bụ n'ihi ọgbaaghara, agha, ọgụ na mwakpo na-eme na mpaghara ebe dị iche iche n'ụwa ugbua. Ọ bụ Ogbunigwe a hapụrụ n'Ugwuta oge Agha na-akpa ike - Eze Eziorsu Ọ bụghị ogbunigwe gbara n'Enugwu- Ndị uweojii Ndị mmadụ na-eji ngwaagha dị iche iche dịka egbe, mgbọ nakwa ogbunigwe bụ nke ha na-atọgbọ n'ụzọ na-amaghị ama. A bịa na mpaghara ọwụw anyanwụ nke Naịjirịa e nwere ogbunigwe ndị dịcha n'ime ala nke e ji lụọ ọgụ Biafra (afọ 1967 ruo 1970). Mana ugbua ndị mmadụ na-arụzi ụlọ nakwa ịkọ ọrụ ugbo n'ebe ogbuniwe ndị a nọ na-amaghị na ụfọdụ ha ka nwere ikike ịgbawa. Ọtụtụ oge ka a na-achọpụta ogbunigwe ndị a n'ala. Na nso nso a ndị uweojii n'Anambra gbawara ogbunigwe achọpụtara n'Ọka. Ya mere akụkọ a bụ iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha mara ihe ha ga-eme ma ha buru ụzọ chọpụta ogbunigwe n'ogige ha. Ụzọ ị ga-esi chekwaa onwe gị ma ịchọpụta ogbuniwe n'ogige gị: Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Haruna Mohammed siri kọwa etu ndị mmadụ ga-eji chekwaa onwe ha ma ha zute ogbunigwe n'ogige ha bụ: Ị chọpụta ogbunigwe n'akụkụ ụlọ gị, rie mbọ mbọ ọsọ si n'ogige ahụ pụọ Anwakwala anwa sị ka i were aka gị mepee, hichaa maọbụ metụ ogbunigwe Gaa mee mkpesa n'aka ndị uweojii, ha ga-abịa chụpụsịa ndị mmadụ n'ogbe ahụ Ngalaba na-ahụ maka ogbunigwe ga-abịa wepụ ya ma buru ya gaa ebe ha ga-agbawa ya Ị gaghị aba n'ogige ahụ ọzọ ruo mgbe ndị uweojii ga-asị na ogbunigwe adịghizi ya E jikwala ogbunigwe dosa n'ụlọ dịka ihe nlereanya maka na o nwereike ịgbawa E jikwala ihe dị ka ekwenti bịa nso n'ebe ogbunigwe nọ Cheta na agbanyeghi afọ ole maọbụ ụdị nchara ogbunigwe tara, na ọ ka nwere ikike ịgbagbu mmadụ Buru ya n'obi na i nwereike izute ogbunigwe ebe ọbụla gụnyere n'ime ọhịa, ọrụ ugbo, ebe obibi dgz.
[ "Ngwagha nuklia", "Naijiria", "Abia Steeti", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Anambra Steeti", "Ebonyi Steeti", "Imo steeti", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50520832
'Ọ bụ ndị amusu na-atụ ụjọ 'Witchcraft Conference' na UNN'
Ọgbakọ a chọrọ ime na mahadum Naịjirịa dị na Nsukka ga-aga n'ihu agbanyeghi nkatọ ụfọdụ na-akatọ ya.
2019-11-23T05:37:20Z
Witchcraft Conference ga-aga n'ihu na mahadum na UNN
Amosu Ọgbakọ mmụta ngalaba akọpọrọ "B.I. Ijeomah Centre for Policy Studies and Research" na-achọ ikpọkọba na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka na-ewu ewu kemgbe maka ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya. Ụfọdọ na-ekwu na ya bụ ọgbakọ ekwesighị ịpụta ihe maka na ọ bụ ọgbakọ ndị 'amusu'. Nwamba ọ bụ amusu n'ezie? Anụmanụ atọ ndị ga-abara gị uru n'ụzọ ị tụghị anya Friday the 13th: Kedụ nkwenye Ndigbo agbanyeghị ụkwụ na nchọpụta? Ndị ọzọ ka a nụrụ na ha achọghị ka ya bụ ọgbakọ pụta ihe maka na ọ nwereike ịgba agwa ndị amusu n'anwụ n'ụzọ ga-emebiri ha ihe. Nke dị na soshal midia kemgbe ụnyahụ bụ na ya bụ ọgbakọ akpụọla afọ n'ala. Mana nke ahụ bụ ezigbo asị dị ka otu onye ọkankuzi Nsukka so ekpokoba ya bụ ọgbakọ achọghị ka akpọ aha ya siri kwuo. Ọ sị na ya bụ ọgbakọ ka ga-amalite ụbọchị Wenezde ọzọ bụ 26 na 27 nke 2019 dịka akara ya. Ya bụ ọkankuzi sị na "ọ bụ ndị amusu na-atụ egwu na ya bụ ọgbakọ ga-agba ha n'anwụ bụ ndị na-etinyere ha ọkpa n'azụ". O kwukwara na ihe niile ahụ dị na soshal midia bụ okpokoto asi, ma sịkwa na ya bụ ọgbakọ ka ga-aga n'ihu. Chidi Ugwu bụ onye sokwa na kọmiti na-kpokoba ya bụ ọgbakọ sị na ya bụ ọgbakọ bụ maka ịme ka ndị mmadụ mata ihe gbasara amusu. N'onu Chidi, "ọtụtụ mmadụ na-eche na ọ bụ amusu na-enye ha nsogbu ma ha nwee ọgbatughị ebụla". Ọ sị na ọgbakọ a ga-eme ka ndị mmadụ ghọta nke bụ eziokwu. Agbanyeghị, Chidi sị na mahadum na-ekwu ka ndị na-ekpokoba ya bụ ọgbakọ kpatu aha ya bu ọgbakọ aka ka ndị mmadụ ghara ighọtahiezi ya. Chidi kwukwara na ọtụtụ mmadụ egosila masị na ịbịa ya bụ ọgbakọ nke bụ na ha ebugharịala ọnọdụ ebe a chọrọ ịme ya mbụ, bugazia ha ebe ga-abata ọtụtụ mmadụ. Lee ihe nkiri a Akụkọ ga-amasị gị Ihe ị ga-eme ma ị hụ ogbunigwe n'ogbe gị Ọbọgwụ akpụpụrụ ụlọikpe maka mkpọtụ emeriela A ga-enyewe ụmụnwoke ọgwụ mgbochi nwa - Ndị dọkinta
[ "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Omenala" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50520292
Flavour, Chidinma, Davido na ndị ọzọ a kpụ n'ọnụ n'izu a
Lee ụfọdụ ihe ndị tụrụ ụzụ n'izụ a n'otu ntabianya.
2019-11-23T10:25:44Z
Flavour, Chidinma, Davido na ndị ọzọ a kpụ n'ọnụ n'izu a
Flavour na Chidimma Ị ma ihe ndị na-ewu ewu ị na-akwado n'ụzọ dị iche iche mere n'izu a? Ọtụtụ ihe sitere n'ihe ndị otiegwu mere, ihe wuru n'ogbe ndị egwuregwu nakwa ihe ndị ọzọ, tụrụ ụzụ n'izu a. Paul na Peter Okoye na ụmụnne ndị ọzọ na-eme otu ihe mana ha anọkọghị ọnụ Ihe 'dị ire' mere n'izu a, ọtụtụ mere ndị mmadụ obi aṅụrị ndị ọzọ mere ndị mmadụ obi mụrịmụrị. Dọrọ oche nọrọ ala ka anyị gbaa gị ụkwụ n'eze: 1) Flavour na Chidinma Akụkọ egwuregwu 'ihunanya' dị n'etiti Flavour na Chidinma fegharịrị n'igwe soshal midịa. Anyị hụrụ na ha abụọ gụkọrọ egwu a kpọrọ Ihunanya ebighiebi '40 years Everlasting', ka ha abụọ setere onyoonyo na-eme ka ndị mmadụ na-eche na ha na-alụzị onwe ha. 2) Burna Boy Otiegwu a gosipụtara na a họrọla egwu ya maka ihe nrite Grammy. Burna Boy ọ ga-abụ onye Naịjiria mbụ ga-erite Grammy? Nke a wee mee ka ọtụtụ ndị a ma ama na-ebunye ya ụkpa ekele. 3) Padita Agu Ọmarịcha nwaanyị a ị hụrụ ebe a wuru ewu n'izu a maka ama ọ gbara maka ihe ọ gabigara n'alụmdị ya. Ihe o kwuru na-emetụ n'obi. 4) Davido Di Chioma gbara n'anwụ maka egwu ọhụrụ ọ kụpụtara bụ nke pụtara n'ime abalị 21-11-19 bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya. 5) Goodluck Jonathan Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Ebele Jonathan, gbara n'anwụ maka ncheta ọmụmụ ya. 6) Timi Dakolo Dakolo tiputara egwu ọhụrụ maka Ekeresimesi n'ụbọchị Fraịde bụ 22 nke ọnwa Nọvemba 2019. Nke a mere o ji wuo ewu n'izụ a. 7) Jose Mourinho Jose Mourinho malitere ọrụ ọhụrụ ya na Tottenham Hotspur kemgbe ọnwa iri na otu ọ pụrụ na Manchester United. Nke a mere o ji wuo ewu n'izu a. 8) Zubby Michael Izu a na 'Gịnị na-afịọ' nke BBC Igbo, ka Zubby Michael bịara chakee: O nwetakwara ọkwa gọọmentị n'Anambara steeti, ka Gọvanọ Willie Obiano mere ya onye ndụmọdụ pụrụ iche n'ihe gbasara mgbasaozi. Akụkọ ga-amasị gị Nwaanyị esiela ma rie nwa ya Ebe ụmụakwụkwọ abụọ mahadum Babcock siri 'daa iwu' Ihe ị ga-eme ma ị hụ ogbunigwe n'ogbe gị
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ikike ụmụnwanyị", "Bọọlụ", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50510024
Etu e si achụ nwaanyị taa na mgbe gboo
Pete Edochie etiela ka ụmụnwoke Igbo kwụsị isekpu ala ma ha chọọ ịgwa nwaanyị lụba ha
2019-11-24T04:46:09Z
Marriage Proposal: Etu ụmụnwoke si agbado nwaanyị taa na mgbe gboo
Ụmụasa Igbo Ụmụada Igbo anaghị eji ụbọchị emume ịlụ ha egwuri egwu Ị kpaa onye okenye aka n'ọnụ gbasara etu ụmụnwoke si agbadọ nwaanyị ha chọrọ ilụ taa, onye okenye ahụ ga-asị gị na ụwa emebiela. Ụmụnwoke oge a na-ahụ nwaanyị ha chọrọ ịlụ buru ụzọ mee enyi, oge ụfọdụ a kwaa iko ma tụọ ya ime tupu ha alarụọ ụlọ ga gwa ndị nwe nwa ebumnuche ha. 'Ụmụwnoke kwụsị isekpu ala arịọ nwaanyị lụba ụnụ' Mana ị ga-ama ụzụ kpụrụ gị ime ụdị ihe dị etu ahụ n'oge gboo. Ihe ise ị ga-emenwuru ụmụnwoke nọ na ndụ gị Burna Boy ọ ga-abụ onye Naịjiria mbụ ga-erite Grammy? Ihe ise i kwesiri ịma maka amụ Ọtụtụ ihe ndị a agbanwela nke mere na ndị okenye na-apụta eti aka n'obi na ndị ntoroọbịa anaghị emeta ya cha cha, ọkachasị etu nwoke si agbado nwaanyị si ya lụba ya. N'ụwa taa, nwoke na-esekpu ala arịọ nwaanyị ma jụọ ya ma ọ ga-alụ ya. Otu onye tiri mkpu ahụ bụ onye a ma ama na-eme ihe onyonyo nke a na-etu Ọgadagidi, Pete Edochie. Isekpu ala gbanye nwaanyị ọla bụ ihe anyị mụara n'aka ndị ọcha Edochie bere nwịị na ọ bụ arụ ka nwoke sekpuru ala rịọ nwaanyị si ya ma ọ ga-alụ ya. O kwuru hoha na nke ahụ abụghị etu e si eme ya n'ala Igbo. O kwuru na nwoke ekwesighi ire ugwu ya ebe nwaanyị ọ chọrọ ịlụ nọ ime ụdị ihe ahụ. Mana ajụjụ ọtụtụ ndị Igbo na-etolite etolite na-ajụ bụ kedụkwanụ etu e si agado nwaanyị n'ala Igbo. Nwoke chọrọ ịlụ nwaanyị, ọ bụrụ na o jighi ọla sekpuru ala rịọ nwaanyị ma ọ ga-alụ ya etu anyị siri mụta n'aka ndị ọcha, kedụ ka ọ ga-esi mee ya? BBC Igbo gbara otu onye okenye aha ya bụ Peter Ezembu ajụjụọnụ ịmata etu omenala si eme ya. O kwuputara ụfọdụ ụzọ e si achọta nwaanyị a ga-alụ n'oge gboo. Di na nwunye bụ ha kpaa tupu ha alakwuru ndị mụrụ ha Ụzọ e si achọta nwaanyị Nkwa alụmdi na nwata nke Bekee 'Betrothal': Ezembu kwuru na ọ bụghị iwu na alụmdi na nwunye ga-abụ n'etiti okenye abụọ maọbụ ndị tolitere etolite. O kwuru n'oge gboo, nne maọbụ nna nwa nwereike ịhụ nwantakịrị si n'ezinaụlọ dị ya mma, ha aga kwee nkwa na nwa ha ga-alụ onye ahụ maọbụ e kwee nkwa na onye ahụ ga-alụ nwa ha oge ha tolitere. Ọzọ bụkwa na nwoke nwereike ịhụ nwaanyị dị ime kwubie na ọ bụrụ na ọ mụọ nwa nwaanyị, na nwa ya ga-alụ ya, e si etu ahụ kwe nkwa maka alụmdi ha n'ọdị n'ihu. Mana n'okwu nke na-eme n'etiti ndị toro eto, Ezembu kọwara na mgbe gboo, nwoke anaghị agwa nwaanyị na ọ chọrọ ịlụ ya maka na ọ bụghị ya na-aga alụta nwaanyị ahụ n'aka ya, kama ọ bụ nna ya na ụmụnna ya ga-alụtara ya nwaanyị. Nke ahụ mere na nwoke ahụ ga-ebu ụzọ gwa nna ya na o nwere nwaanyị ọ hụrụ. Nna ya ga-akpọrọ otu onye ụmụnna ya ga na be nwaanyị ahụ ga gwa nna nwaanyị na o nwere ọrọma chara acha ha hụrụ n'ụlọ ha, ha chọrọ ịwọrọ, kọwaa etu nwaagbọghọ ahụ dị. Ebe ahụ ka ha ga-amalite nna nwa ahụ ga-akpọpụta nwagbaghọ ahụ gwa ya na nwamadị ahụ chọrọ ịlụ ya ma o kwetara. Ụmụada Igbo anaghị eji ụbọchị emume ịlụ ha egwuri egwu Nwa agbọghọ ahụ kweta, e tinyezie ụbọchị nwoke na ụmụnna ya ga-abịa. Mana taa, nwoke hụ nwaanyị ọ chọrọ ịlụ, o buru ụzọ sekpuru ala, nye ya ọla jụọ ya ka ọ g-alụ ya, nwaanyị ahụ kweta, ha aga n'ụlọ ya gaa jụzie nne na nna ya. Nke ahụ ka Edochie sịrị mba na ọ dịghị mma. Mana ajụjụ bụ o nwere ihe ọjọọ dị na ya? Ọ bụrụ ya bụ naanị otu oge nwoke ga-esekpuru nwaanyị ya ala, ọ dị njọ? Ajụjụ a ka anyị jiri gakwuru Pete Edochie onye gbara isi akwara sị mbakwa, nwoke anwala ya anwa. Mana omenaala bụ mmụta mmụta, i weta ebe a, i tinye ebe a, ụmụntoroọbịa Igbo anatala ndị ọha nke ahụ, ha kwukwara na ha ahụghị ihe ọjọọ ọbụla na ya. Oge BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ ihe ha chere gbasara ya na Facebook, ụfọdụ kwuru na ọ dị mma ebe ụfọdụ kwuru na ọ jọgburu udele sigbuo nkakwụ n'isi. Otu ihe dị mkpa n'alụmdi na nwunye bụ nkwekọrịta dị n'etiti mmadụ abụọ ahụ. Etu ọbụla o si dị onye mma, ya mee makana omenaala na-agbanwe agbanwe. Nwa ntịị ebe a, nwa ntịị ebe a, ụnụ a na-aga. Akụkọ ndị ga-amasị gị A ga-enyewe ụmụnwoke ọgwụ mgbochi nwa - Ndị dọkinta Nwaanyị esiela ma rie nwa ya Ebe ụmụakwụkwọ abụọ mahadum Babcock siri 'daa iwu'
[ "Alụmdịnanwụnye" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50514447
Ihe ndị chabara anya na mmemme Afrimma 2019
Emume African Muzik Magazine Awards (AFRIMMA) bịara na njedebe ụnyaahụ mana ọ ka na-ewu ewu maka ụfọdụ ihe kpọtụrụ ebe ahụ.
2019-11-24T07:40:51Z
AFRIMA Awards 2019: Ihe ndị chabara anya na mmemme a
Ndị oti egwu A na-ekwukarị na ngwụcha izuụka ọbụla na-abụ oge eji akpa obi aṅụrị. Ọ kpọtụrụ akpọtụ na ngwụcha izuụka a na mba Amerịka, dịka ụgbọ mmemme African Muzik Magazine Awards (AFRIMMA) chịkọtara ọtụtụ ndị ama ama na-eti egwu n'Afrịka. Burna Boy ọ ga-abụ onye Naịjiria mbụ ga-erite Grammy? Flavour, Chidinma, Davido na ndị ọzọ a kpụ n'ọnụ n'izu a Ndị dịka Fally Ipupa, 2Baba, Zlatan Ibile, Rema na ọtụtụ ndị ọzọ bịara ya bụ emume. Site n'ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ emume, lee ihe ndị chabara anya n'emume Afrimma nke 2019. Etu o si gaa na soshal midia Ka otu na-ehibe mmemme a kwuputachara na @Nikita_Kering bụ oti egwu ama ama na mpaghara ọwụwa anyanwu Afịrịka dị afọ iri na asaa(17), ndị mmadụ bido kwuwe na nke a nwere ajụjụ so ya. Lee ihe otu onye juru. @lexzy4rael gara n'ihu kele nwada a kwuru na ọ dị afọ iri na asaa bụ oti egwu egwu ama ama na mba Kenya nakwa Afịrịka. @obiadohtv kwuru na ihe ngosi Teni na-eti egwu tọrọ ya ụtọ nke ukwu. @ValieDan sepụtara onye Moroko yi uwe Ankara nke Afịrịka wee wụchie na mmemme ahụ. @MicheyMiles na-ekele Awilo Logomba onye nke o kwuru kpara ya obi ụtọ mgbe o na-etolite etolite. @iotama22 sepụtara okwu mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi na ngosi omenaala Naịjịrịa bụ Lai Mohammed kwuru na etu ndị mmadụ si na-akwa ya emu. AFRIMMA nke 2019 mere na Dallas, Texas ebe ndị dịka Zlatan bụ otiegwu Naịjirịa ritere nturuugo ọkaibe na ndị malitere tiwe egwu ọhụrụ nakwa maka egwu akpọrọ "Killin Dem" nke ya na Burna Boy tiri. Burna Boy bụzị akara ọkụ ugbua na ndị na-eti egwu na Naịjirịa, ritere nturugo ọkaibe n'iti egwu na mba Afrịka. Lekwa ụfọdụ ndị Naịjirịa ndị ọzọ ritere nturugo na ya bụ mmemme nke 2019 Phyno- Ọkaibe na ịma mbem Burna Boy x Zlatan - Killin Dem- Egwu bụ ọkaibe Rema - Dumebi: Ihe onyonyo kachasị Davido- Ọkaibe maka itiegwu gafere mba ofesi Mercy Chinwo- Ọkaibe n'iti egwu ụka Izzy Odigie- Ọkaibe n'ịgba egwu na mba Afịrịka niile Akụkọ ndị ga-amasị gị: Etu e si achụ nwaanyị taa na mgbe gboo Chelsea jụrụ na-agaghịzị agwọ ha ka abacha ọzọ Ihe ise i kwesiri ịma maka amụ 'Ọ bụ ndị amusu na-atụ ụjọ 'Witchcraft Conference' na UNN' Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Omume", "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria", "Afịrịka", "Abụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50542904
Ụlọikpe sị Maina weta otu ijeri naịra ma ya chọ isi be ya abịa ikpe
Maina ga-enye ụlọikpe otu ijeri naịra ma kpọtakwa sịnetọ abụọ ga-eji nde narị naira ise gara ya akaebe.
2019-11-25T07:50:44Z
Ụlọikpe sị Maina weta otu ijeri naịra ma ya chọ isi be ya abịa ikpe
AbdulRasheed Maina Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja sị onye bụbụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ego ezumike nka bụ Abdulrasheed Maina ka o wete otu ijiri naira iji nwe ohere isi be ya na-abịa ikpe. Maina pụtara n'ihu Ọkaikpe Okon Abang tata ịzara ọnụ ya maka ebubo mpụ na nrụrụ aka mgbe ọ ka nọ n'ọrụ ọha. N'iji nye ya ohere isi be ya abịa ikpe, Ọkaikpe Abang sị ka Maina kpọta mmadụ abụọ ga-anara ya aka ebe. Ndị ga abụrịrị ndị omeiwu sịnetọ ga-enye ụlọikpe nde narị naịra ise ma nwekwa ụlọ n'obodo Asokoro di n'Abuja. Buhari sị ka ndị ọrụ ikpe tinye uju maka ihibe ụlọikpe ọpụrụiche Muhammadu Buhari Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya Ka anyị malite n'Abuja ebe onyeisiala Mohamadu Buhari sị ndị ọrụ ikpe ka ha hụ na-ehibere ụlọikpe ọpụrụiche ga-enye aka n'ịhụ na ekpere ikpe ọsịsọ na Naịjirịa. Buhari kwuru nke a na nzukọ ndị ọkaikpe opụrụiche na-aga n'ihu n'Abuja Anyị enweghi ndi ehibere maka ịlụsị Ipob ọgụ - Ebonyi steeti Biafra na Naịjirịa Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ N'Ebonyi steeti gọọmentị akatọọla ebubo a na-ebo ha hibere otu akpọrọ "Bakassi Boys" iji lụsị ndị Ipob ọgụ. Maazị Stanley Emegha bu Kọmisọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Ebony sị na asịrị a ndị kpọro onwe ha "The Biafra Restoration Voice" na ekesa abughị eziokwu maka o bụ sọsọ otu akpọrọ Neighborhood Watch ka Ebonyi nwere maka nchekwa N'ofesi, kENYA LANDSLIDE Ihe ruru mmadụ iri ise na isii anwụọla na mbụze oke mmiri bụtere na mpaghara West Pokot nke Kenya. Mmadụ iri atọ ndị ọzo ka na efuefu ebe ihe karịrị narị enweghịzi ulọ na-eze n'ime ụlọ ụka na ụlọ akwụkwọ. N'egwuregwu A referee showing a red card Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NPFL amachiela Paul Komolafe nke Nasarawa United otu afọ maka mwakpo onye obu bọọlụ mgbe ha zutere Plateau United NPFL sị na Komolafe kwanyere ndị na-akwado ha ịwakpo ndị na-ahị ya bu egwuregwu A dakwara otu egwuregwu ahụ ọkankụ ego. Nwaanyị na nwa ya Otu Nwaanyị a kpọrọ Temitope Akinola dị afọ iri anọ na abụọ ji ọgwụ 'Sniper' gbuo nwa nwa ya iji gbochie ọlụlụ di na nwunye nne na nna nwata ahụ. Nwaanyị a bi n'Isote nke Sagamu dị n'Ogun Steeti kpara arụ a n'ụbọchị Tọzde mana ndị uweojii na ngalaba ahụ nwụchiri ya n'otu ụbọchị ahụ. Nwaanyị esiela ma rie nwa ya Ọnwụ nwa m dị m ka ọ bụ na nrọ - Nwaanyị a wakporo ma togbuo nwa ya Ọnụ na-ekwuru ndị uwojii n'Ogun steeti bụ Abimbola Oyeyemi nwaanyị a kpọrọ nna nwata ahụ asị nke mere mgbe nne ya gara ịsa ahụ ka ọ were ọgwụ 'sniper' cheenye nwata ahụ n'ọnụ. Mgbe nne ya sachara ahụ wee pụta, ihe o zutere a bụrụ ozu nwa ya ka ọ tọgbọrọ n'ọnwụ. Mgbe ndị uweojii gbara nnenne nwata ahụ ajụjụ, ọ sị na ọ bụ ya gburu nwata ahụ maka na ọ chọghị ka nne ya lụọ nna ya. Dịka ọ dị ugbua, e bugala ozu nwata ahụ n'ụlọọba ozu nke ụlọọgwụ Mahadum Olabisi Onabanjo ebe a ga-enyocha ya. Okpomọkụ achagbuola ụmụaka abụọ n'ime ụgbọala E bola nne nwaanyị ebubo ọnwụ ụmụaka ya abụọ ka a chọpụtara ozu ha n'ime ụgbọala na-ekpo ọkụ na Queensland dị n'Australia. Ndị uweojii chọpụtara ụmụaka ahụ dị afọ otu nakwa afọ abụọ n'ọnọdụ ekughị ume. Amabeghị ka ha si nọdụ n'ime ụgbọala ahụ. Mana otu onye uweojii kwuru na ahụ ụmụaka ahụ na-egosi na ọ bụ ọkụ chagburu ha n'ime ụgbọala ahụ. Kerri-Ann Conley dị afọ iri asaa bụ nne ụmụaka ahụ bu onye mbụ eboro ebubo igbu mmadụ kamgbe adọtịrị iwu ka ọ gụnye ejighị ndụ mmadụ kpọrọ ihe'. 'Nye nu onyeisiala na ndị gọvanọ ohere ọchịchị ugboro atọ' Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile Otu onye APC n'Ebonyi steeti bụ Charles Oko Enya agwala ụlọikpe dị n'Abakaliki ka e nye onyeisiala na ndị gọvanọ ohere ịchị nke ugboro atọ. Ọ sị na ọchịchị ugboro abụọ megidere iwu ikike dịrị onye n'Afrịka. N'egwuregwu Leciester City na ha achọla ighọ elelie nwa ite anya ọgbọnyụọ ọkụ n'asọmpi league dịka ha bụ ndị abụọ n'ogogo tebụlụ. Otu egwu na ha akpala ike dị egwu etu ha si mee ya n'afo 2016 mgbe ha buru Iko premier league. A ga-ewepu ikpe ọnwụ n'iwu akpọrọmasị Sịnetọ Sabi Abdullahi kwadoro iwu okwu akpọmasị ekwuola na ọ ga-ewepụ ikpe ọnwụ dịka ntaramahụhụ nye onye dara iwu a. Abdullahi onye kwụpụtara nke a n'ụbọchị ụka sị na ndị ụlọomeiwu ga-ahazitụ iwu a mgbe ha ga-ezuko ịdọrịta ụka maka ya. 'Operation Kpochapụ' n'Anambra Steeti' Ụkọ ọrụ na-ebute nnupu isi n'iwu Ị nụtụla maka Operation kpochapụ n'Anambra Steeti bụ emume ndị uweojii sị ha ji ekpochapụ mpụ n'ọnwa emba ndị a. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed sị na ha anwụchiela mmadụ iri asaa n'emume a bụ mere mpụ dị iche iche na steeti ahụ. N'ofesi Ndịagha nchekwa mba Amerịka achụọla odeakwụkwọ ndịagha nzuzo ha bụ Richard Spencer maka agwa ọjọọ onye agha nọ n'okpuru ya kpara. Onye agha a kpọrọ Edward Gallagher nọ n'akụkụ ozu nwụrụ anwụ see foto n'Iraq nke mere e ji maa ya ikpe ma wetuo ya n'ọkwa. N'egwuregwu Sheffield United bụụrụ agada gbachiri ụzọ nye Manchester United dịka ha jụrụ ka Man United merie ha n'asọmpi Premier League. Ọ fọrọ tịkọm tịkọm ole ka e gbuchie bọọlụ mgbe Sheeffield bịara saa goolu mere ha ji gbaa ọkpụ atọ ọkpụ atọ. Nkeji Ihe nkiri
[ "Okike", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Amerika", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Manchester United", "Anambra Steeti", "Ụmụaka", "Ogun steeti", "Mmeru nwata" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50542907
Atụmatụ IPPIS ga-egbu agụmakwụkwọ na Naịjirịa - ASUU
Otu jikọtara ndị nkuzi mahadum na Naịjirịa bụ ASUU ekwuola etu atụmatụ IPPIS ga-esi megide ha.
2019-11-25T13:22:06Z
IPPIS Registeration: Ihe mere anyị achọghị iso n'atụmatụ IPPIS - ASUU
Mahadum Naíjiría. Ọ bụghịzi akụkọ na gọọmentị etiti na otu jikọtara ndị nkuzi mahaduma na Naịjirịa anaghị esi otu ụzọ aga n'okwu banyere ụfọdụ ihe. Otu n'ime okwu ndị ahụ bụ nke a kpọrọ 'Integrated Payroll and Personnel Information' bụ usoro e ji edebanye aha maka ịkwụ ụgwọ ọnwụ. 208bn TETFund: ASUU ọ ga-agba abụbụọrụ ọzọ? Ndị ọrụ ụlọọgwụ psychiatric Enugu chọrọ igbachi ya Gọọmentị etiti chọrọ ka ndị nkuzi mahadum malite soro n'atụmatụ a n'ụbọchị 25 Nọvemba, 2019 mana ha kpọrọ ekwe nkụ sị ọ gaghị adị ha mma n'ahụ. Onyeisi otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum bụ ọkankuzi Biodun Ogunyemi gwara BBC Igbo sị o megidere ikike mnwereonwe ndị mahadum na Naịjirịa n'ụzọ ndị a; Atụmatụ IPPIS ga-eme ka onye nkuzi ọbụla gaa debanye aha n'Abuja tupu a kwụọ ya ụgwọ ọnwa, bụ nke megidere iwu eji hiwe madaduma na Naịjirịa. Igbochi ohere agụmakwụkwọ maọbụ nkuzi ihe site n'aka ndị ọkankuzi si na mba ofesi - Nke bụ na onye ọbụla si ofesi na-abịa ikuzi ihe ga-eche ka gọọmentị etiti nye ikike tupu ọ malite. O kwuru na oge nke a ga-efu ga-eme ka e gbochi ụdị ndị a ịbịa kuzie ihe. Nke ọzọ bụ na ego ọnwa ndị a ga-anọte aka tupu a kwụọ ya ebe a na-achọ inwete ikike n'aka gọọmentị etiti. Ọ ga-egbochi ohere mahadum ndị Naịjirịa nwere iji maa nke ndị mba ndị ọzọ aka n'ihu. Ọ sị na a bịa n'ibuagha megide mpụ na nrụrụaka, bụ ebe gọọmentị gbakwasịrị ụkwụ tinye atụmatụ a, na mahadum nwere usoro ha ji ebuagha megide mpụ dị n'ime ha. Mgbochi nwulite akụnaụche n'ime mahadum nke bụ na tupu ewere onye nkuzi ọbụla n'ọrụ, gọọmentị etiti ga-ama maka ya. Ogunyemi sị na ha eburula okwu a gaa n'ụlọomeiwu bụ ndị kwere nkwa na ha ga-elebanya n'ime ya. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na gọọmentị chọrọ ihiwe ụdị atụmatụ a, ka ha nye mahadum dị iche iche ime nke n'ime ụlọ ha. Na ọ bụ ụdị atụmatụ a ka ha gwara ndị ụlọomeiwu bụ nke ha sịrị ha gaa leba ya anya. Ogunyemi dọrọ ndị otu ya aka na ntị ka ha ghara itinye aka n'atụmatụ IPPIS ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Aka m dị ọcha - Allen Onyema Etu e si achụ nwaanyị taa na mgbe gboo Sheffield a bụrụla anụ kpọrọ nkụ juru Man Utd ọnụ
[ "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50514448
Ihe ise ị ga-eme ma ọ bụrụ na esemokwu ezinaụlọ na-emekpa gị
Lee ụzọ ise ị ga-eji gbanarị mmekpa ahụ ọgbaghara ezinaụlọ maọbụ mwakpo na-ebute.
2019-11-25T14:34:40Z
Violence Against Women: Ihe ise ị ga-eme ma ọ bụrụ na esemokwu ezinaụlọ na-emekpa gị
Di na nwunye Ọtụtụ ụmụnwaanyị nwere ụzọ ole na ole ha si a nabata mmegbu dị n'ezinụlọ nakwa mwakpo n'udiri ọbụla. Nke a mere ka otu United Nations wepụta ụbọchị Nọvemba iri abụọ na ise n'afọ ọbụla ịkusi okwu ike maka nkwụsị atụmaatụ ọjọ a. Ị wakpo nwaanyị maọbụ ụmụaka, anyị a pịa gị amụ - Ụlọomeiwu Ekiti Buhari: Buo agha megide mwakpo ụmụaka Lee ihe ịse ị ga-emenwu iji gbanarị udiri nwakpo ọbụla Titilola Vivour Adeniyi bụ ọkaiwu ma bụrụkwa onyeisi ngalaba 'Lagos State Domestic Violence Response Team' na-ahụ maka iza oku ndị awakporo awakpo na Legọsị kwuputere ihe ndị a dịka: Kiki Mordi na-enye ụmụnwaanyị ndụmọdụ 1. Kwupute okwu Vivour rịọrọ ka ụmụnwaanyị ghara ịtụ ụjọ ikwupute maka etu esi wakpo ha maọbụ awakpo ha. O kwuru na nkwupute ga-enyere gị aka ka inweta enyemaka zuruoke ga-eme ka aka kpara onye na-awakpo gị. 2. Nwee ihe ngosi ị ga-eji chere onye ahụ n'ụlọikpe Vivour kwuru na ihe ngosi a ga-apụta site n'iga mee ahụ gị nyocha n'aka dọkịta, ihe ọ bụla o dere maọbụ nyochapụtara bụ ihe ị ga-eji chere onye wakporo gị n'ụlọikpe. 3. Wepụ okwu ahụ n'ụlọikpe O kwuru na enwela iwu megidere onye ọbụla wakporo nwaanyị na Legọs steeti. O kwukwara na nwakpo bụ agwa megidere steeti ya mere ntaramahụhụ so ya bụ ịga mkpọrọ ebiebi. 4. Bido na nwa kuziwere ụmụ gị maka ihe ọjọọ dị na ịmegbu mmadụ Ọ ga-adị mma ka ndị mmadụ site n'obere kuziwere ụmụ ha bụ nwoke maka etu esi akwanyere ụmụnwaanyị ugwu. Vivour kwukwara na ọ ga-adị mma ka ụmụnwoke bido na nwata hụtawa ụmụnwaanyị dịka mmadụ ibe ha. 5. Obodo kwesiri ị guzo kwado ụmụnwaanyị ka ha kwuputa maka mwakpo Vivour chọrọ ka obodo kwado nwaanyị ọbụla beputere akwa na a na-awakpo ya ebe ọbụla. Ha mata na o nwereike ịbụ onye nke ha echi. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ihe mere nwaanyị ji were ọgwụ anwụ gbuo nwa nwa ya Atụmatụ IPPIS ga-egbu agụmakwụkwọ na Naịjirịa - ASUU Etu e si achụ nwaanyị taa na mgbe gboo Aka m dị ọcha - Allen Onyema
[ "Naijiria", "Ikike ụmụnwanyị", "Ụmụnyanyị", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50547203
Allen Onyema tụkwasịrị m asị - Nnamdi Kanu
N'ozi ozigara ndị otu ya, Nnamdi Kanu tinyere ọnụ n'ihe Allen Onyema na-agabiga.
2019-11-25T16:19:32Z
Allen Onyema tụkwasịrị m asị - Nnamdi Kanu
Nnamdi Kanu Ndị mmadụ ka na-etinye ọnụ n'ihe dakwasịrị onyeisi ụlọọrụ ụgbọelu bụ Allen Onyema dịka mba Amerịka boro ya ebubo nrụrụaka. Agbanyeghi na Maazị Onyema ekwuola na aka ya dị ọcha, Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ ka ekewa Naịjirịa akpọrọ Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) sị na ihe mere ya si ya n'aka. Ihe 5 Allen Onyema gwara Nnamdi Kanu Ihe Geoffrey Onyeama kwuru maka Nnamdi Kanu Lee mgbe Nnamdi Kanu ga-abata Naịjirịa - Paul Achalla Maazị Kanu kwuru okwu n'ụbọchị ụka bụ nke 25 nke ọnwa Nọvemba n'ime gbasaozi ọ na-ezigara ndị otu ya were sị na ọ bụ eziokwu na Maazị Onyema Bịafra be ya. Ọ sị ọ bụ maka ikwu okwu banyere Naịjirịa ka Onyema jir bịa. "Maazị Onyema kwuru okwu banyere ihe nwereike iso atụmatụ kwara pụọ ndị ntoroọbịa Arewa kpụ n'ọnụ mgbe ahụ. "Anyị kwuru maka ọtụtụ ihe mana otu ihe o chefuru bụ na a bụ m onye Biafra izizi, nke mere na agaghị m erinwu aka azụ." Kanu gara n'ihu kwuo na Maazị Onyema sị na ya chọrọ ịhụ ka udo ga-adị ka aghara igbu ndị Igbo n'ugwu awụsa. "A sị m ya ihe ọbụla ọchọrọ ime ya gaa n'ihu mee maka mu onwe m chọrọ udo." Kanu sị na Onyema sị ka ya na ndị ya na ha so bịa see foto,. "Asịghị m ha mba, maka dịka onye Igbo toro n'ụlọ, anyị anaghị asị ndị ọbịa anyị mba." Maazị Kanu kwuru maka ihe Maazị Onyema gwara BBC Igbo na mkaprịtaụka ha nwere. Ọ sị na ọ tụkwasara ya asị ma chuo ya ihu. Mana, ihe Maazị Onyema kwuru na ya bụ mkparịtaụka bụ na Kanu nabatara ya na ndị ha na ya so mgbe ọ gara be ya. Ọ kwukwara na Kanu nabatara atụmatụ udo ya jiri bịa ma kpọnye ya nwanne ya nwoke ka o soro ga njem mmụta etu a ga-eji hibe udo na Naijirịa. Kanu agbaghaghi ihe Onyema kwuru na-abụghị ị sị na ọtụrụ asị. Lee ihe Onyema kwuru na mkparịtaụka ahụ ebe a: Ihe 5 Allen Onyema gwara Nnamdi Kanu. Lekwa ihe ndị ọzọ o kwuru na ya bụ mkaprịtaụka: Kanu sị na ọ bụ okwu ya kwuru maka Allen Onyema mere ndị Amerịka ji nyochawa ha, mana ihe BBC ma maka ya bu okwu gosiri na ọ bụghị njem taa nke ojrii bụrụ nke ọnwa ole maọbụ ole. Ọ sịkwa na Maazị Onyema mere ezigbote mmeghi n'itinye onwe ya n'ihe ọ sị ka ya aka. "Onyema chọrọ ịmasị ndị Fulani site na-ịgwa ha na ya na Nnamdị Kanu nwere mkparịta ụka. Ọ bụ ezigbote mmeghi." Part 3: 'Ana m abịa n'ike na ebube' - Nnamdi Kanu Ọ sị na ihe mere Onyema bụ na ndị na-achụ ya mara na ndi Ipob agaghị akwụ onye katọro ha n'azụ. Agbanyeghi ihe ndị a okwuru, Kanu gakwara n'ihu sị na ndị na-achụ Onyema adịghị achụ ọtụtụ ndị ọzọ ọ sị aka ha dị na nrụrụaka. Cheta na mba Amerịka boro Maazị Onyema ebubo n'aka ya dị na mpụ na nrụruaka. Maazi Onyema sị n'aka ya dị ọcha n'ebubo a niile a na-ebo ya. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Nnamdi Kanu", "Mpụ", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50510164
Ị na-anụ maka Dan Anyiam, gịnị ka ị ma maka ya?
Akụkọ a ga-akọwara gị maka ihe ị kwesịrị ịma maka nwoke a aha ya dị n'ọgbọegwuregwu dị n'Owere.
2019-11-26T05:55:29Z
Dan Anyiam: Gịnị ka ị ma maka dimkpa Igbo a?
Ọdọ egwuregwu Gịnị ka ị ma maka Daniel Amobi Amadi Anyiam? Ọ bụrụ na ị na-ele egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa, e nwereike ị nụtụla mgbe a gbara bọọlụ n'ọgbọegwuregwu a kpọrọ "Dan Anyiam Stadium". Mana ị ma onye nwoke a bụ? Gịnị ka ị ma maka Chinua Achebe debanyere aha ya n'obi ndị Naịjirịa? Gịnị ka ị ma maka Eni Njoku; nwaafọ Igbo isi ya na-apụ ọkụ n'agụmakwụkwọ? Nna Odumegwu Ojukwu kpara akụ eriwe agwụ agwụ Ngwa gbado anya n'akụkọ a ka ị chọpụta. Ihe ị kwesịrị ịma maka Dan Anyiam A mụrụ ya ụbọchị 26 nke ọnwa Nọvemba, 1926. Ọ gụrụ akwụkwọ ebe a na-azụ ndị nkuzi nke a kpọrọ 'Teacher's College' Ọ gbaara Naịjirịa bọọlụ ma bụrụkwa onye ndu nke otu egwuregwu Naịjirịa na-enweta, n'afọ 1949. O mechara bụrụ onye nchịkọta 'coach' otu egwuregwu Naịjirịa site n'afọ 1954 ruo 1956 ma chịkwaa ọzọ site n'afọ 1964 ruo 1965. Ọ bụ ya bụ onye Naịjirịa mbụ chịkọtara otu egwuregwu bọolụ Naịjirịa ka Jack Finch bụ onye mba Ịngland chịchara. Anyiam bụ onye mbụ chịkọtara otu Rangers dị n'Enugwu steeti. A gụrụ ọgbọegwuregwu dị n'Owere, Imo steeti, aha ya. Ọ nwụrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Julaị 1977, ka ọ dị naanị afọ 51. Akụkọ ga-amasị gị: Allen Onyema tụkwasịrị m asị - Nnamdi Kanu Ihe ise ị ga-eme ma ọ bụrụ na esemokwu ezinụlọ na-emekpa gị Atụmatụ IPPIS ga-egbu agụmakwụkwọ na Naịjirịa - ASUU Ụgbọelu bụ mmadụ 18 akpọkasiala n'ụlọ ndị mmadụ na Dr Congo Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Naijiria", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50514449
Ihe ndị mmadụ na-eme iji chaa ọcha
Ụmụ Naịjirịa na-eti mkpu maka etu otu nwaanyị si kwe ka ewere 'kemikalụ' na-ewochasị ahụ ya ka o wee chaa ọcha.
2019-11-26T13:37:15Z
Bleaching the skin: Ụzọ ọzọ ndị mmadụ si achọ ịcha ọcha
Onye na-etecha ihu Nwanne ihe anya hụrụ gbasara ụzọ ọhụrụ ụmụnwaanyị si agbanwe ahụ ha ka ha chaa ọcha dịkwa egwu. Nke a mere ka ndị mmadụ bido gosiwe mgbagọjụ anya ha maka atụmaatụ a ndị na-eme ya kwuru na ọ nọ ọnụ puku naịra iri atọ. Ihe ude ịcha ọcha na-eri ụmụnwaanyị? Lekwa ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia @aquillox kwuru na nke a riri ya ọnụ. @Jason_Cryptoz kwuru na ahụ mara ya riri mgbe o kiriri atụmaatụ a n'onyonyo na-efegharịnu. @Amsantiedo kwuru na ndị a egbuo ndị a. @DohdohChichi kwuru na ọ bụ onye isi oji etu ahụ ya si acha na-amasị mere ihe a. Lee ụzọ ole na ole ndị mmadụ si eji ude acha ọcha Dkta Chidinma Gab-Okafor kpọpụtara ụzọ anọ a dịka etu ndị mmadụ si eji awụchapụ elu ahụ ha. Nchagharịtụ(Toning) Isi n'oji fere ọcha(Whitening) I ji ude wepụ pimpụlụ(Clarifying) Nchagharịtụ karịa etu isi achabu(Lightening) Dkta Gab-Okafor kwuru na nne ji udiri icha ọcha ọbụla bụ ihe bekee kpọrọ Bleaching. I mana ite ude ga-acha gị ọcha nwereike ị na-agị ịmụ nwa? Ihe ndị a socha bụrụ ọghọm dị n'ịwụchapụ elu ahụ mmadụ. Ahụ gbagọrọ agbagọ Ngozi eriri ime ahụ (Visble vain) Nje Mmerụ ahụ ana ana Ihu faanta , ọkpa koku Aka ojoko amịrịamị Araghụhị ụra ọfụma Ọria akpụ nke elu ahụ O na-emetụta afọ ime Akụkụ ahụ gị ịwụchapụ elu ahụ nwereike ịla n'iyi Ụbụrụ Umejuanụ Ọbara Elu ahụ Akịrị Akụkọ ndị ga-amasị gị Ị na-anụ maka Dan Anyiam, gịnị ka ị ma maka ya? Ihe ise ị ga-eme ma ọ bụrụ na esemokwu ezinụlọ na-emekpa gị Allen Onyema tụkwasịrị m asị - Nnamdi Kanu
[ "Naijiria", "Ikike ụmụnwanyị", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50557816
Tekinụzụ '5G network' a na-abịa ọ ga-agbanwe ndụ gị?
Nkọwapụta ihe teknụzụ '5G network' bụ na ụrụ ọ bara maka nzirita ozi n'ekwentị.
2019-11-26T14:31:44Z
Tekinụzụ '5G network' a na-abịa ọ ga-agbanwe ndụ gị?
Teknụzụ ekwentị 5G network Dịka mmadụ na-eto n'ogodo na ndụ, etu a ka tekinụzụ banyere ekwentị a kpọrọ 'Network' sị eto nke ya sịte n'ọgbọ ruo n'ọgbọ. E nwere ọgbọ ndị gụnyere nke mbụ (1G), abụọ (2G), atọ (3G), anọ (4G) na nke kachasị ọhụrụ nakwa ka a adị elu bụ nke ise (5G). 'Ụzọ ị ga-eji chekwa akara gị' Ị nwereike kote buru maka ihe idere na soshal midia Tekinụzụ '1G network' ruo na '4G network' nọ bu na Naịjirịa mana ugbua onyeisiala Buhari etinyeaka n'akwụkwọ ịnabata '5G network' na Naịjirịa. Ngwa gee ntị ka anyị kọọrọ gị ihe bụ tekinụzụ '5G network' na etu o si arụ ọrụ. Gịnị bụ '5G network'? 5G nke pụtara 5th 'Generation' na Bekee bụ ọgbọ nke ise n'ogogo tekinụzụ 'network' ekwentị . E nwereike ịkpọ ya '5G New Radio'. Tekinụzụ 5G anaghị ejikọ naanị ndị mmadụ n'ekwentị kama ọ na-ejikọ ọtụtụ igwe tekinụzụ dị iche iche nke na-enyeaka iwulite nrụpụta. Ọ na-eme ka ụzọ nzirita ozi n'ekwentị gụnyere ederede (text), foto (image), ihe onyonyo (video) bụrụ 'saaraa' na-enweghi nsogbu ọbụla. 5G network na-eme ka nzirita ozi n'ekwentị gbaa ọsọ dị egwu (2Gbit/s) nke bụ na tupu i mechie anya mepee, ozi e ziri eruola eluigwe. Ndị ọkanmụta sị na 5G network ga-amụta ego ruru ijeri dọla 3.5 na ohere ọrụ ruru nde 22 n'afọ 2035. Ọgbọ teknụzụ ekwentị ndị ọzọ e nwere gụnyere; Ọgbọ nke mbụ (1G) - Ọ na-anabata naanị iji okwu ọnụ (voice) ezirita ozi n'ekwentị. Ọgbọ nke abụọ (2G) - Na-abata okwu ọnụ na edemede (voice and text). Ọgbọ nke atọ (3G) - Na-anabata okwu ọnụ, edemede, foto, onyonyo (mobile data). Ọgbọ nke anọ (4G) - Na-anabata okwu ọnụ, edemede, foto, onyonyo dgz (mobile internet).
[ "Tekinụzụ", "Naijiria", "Ekwentị", "Social media" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50566465
Ha chọrọ ịtọgbu ma nara m ụgbọala m - Ọkwọụgbọala Taxify
Onye na-akwọ ụgbọala e ji ịntanet akpọ ọrụ kwuru na ha na-adanye n'aka ndị ekperima, ndị ntọrị, ndị ọgwụego, na ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche.
2019-11-26T19:53:29Z
Taxify Driver: Ihe m na-agabiga dịka onye ọkwọụgbọala
Taxify Otu onye ọkwọụgbọala e ji ịntanet akpọ oku ọrụ a kpọrọ 'Taxify' kọwaara BBC Igbo ụfọdụ ihe ha na-agabiga n'ọrụ ha. Nwaamadi ahụ onye BBC achọghị ịkpọ aha ya iji chekwa ya, kwuru na "ọrụ ha siri ike ọkachasị n'abalị." O kwuru na ha na-ezute ndị ekperima, ndị ntọrị, ndị ọgwụego, na ndị yahoo-yahoo n'ọrụ ha. Ụlọoriri dị na Lagos etiela onye ntaakụkọ BBC ihe, kpachie ngwaọrụ ya Nwaamadi ahụ gwara BBC na "O nwere otu ụbọchị m butere ụmụntorobia na Lekki. Ha gwara m na ha na-aga Apapa. Amaghị m na ebumnobi ha bụ izu ohi." "A pụta n'ụzọ otu onye kpọrọ ha n'ekwentị ha sị na ọ bụ Ikoyi ka ha chọrọ ịga." Ka ha pụtara n'ụzọ, ndị ntorobịa ahụ tiri ya ihe chọọ ịnara ya ụgbọala ya, mana ọ zọtara onwe ya, gbaa ọsọ ndụ. Ọkwọụgbọala ahụ onye kwuru na ya bụ ihe mere ebe elekere mbụ nke ụtụtụ, kwuru na ọ bụ ya bụ mbụ na ikpeazụ ọ rụrụ ọrụ abalị. "Kemgbe ahụ, elekere asaa maọbụ asatọ kụọ, m mechie ọrụ." Nkwupụta a na-apụta dịka akụkọ pụtara na ndị banyere ụgbọala ya gburu otu ọkwọụgbọala Taxify a kpọrọ Gabriel Wisdom n'Ajah dị na Legọs na nso nso a. Ihe ndị ọzọ ọ gụpụtara ndị mmadụ na-eme ha gụnyere: Ụfọdụ ndị mmadụ ga-agwa gị ebe ha nọ mana i rute, ebe ha gwara gị abụghị n'ezie ebe ha nọ. Ụfọdụ ga-agwa gị ebe ha chọrọ ịga, i buru ha gaa ebe ahụ, ha asị gị na ọ bụghị ebe ha na-aga. Ụfọdụ ndị wayo ga-agwa gị ebe ha na-aga, ị rute ebe ahụ kama ịkwụ gị ụgwọ, ha agwa gị na ekwentị ha anyụọla ọkụ, i sie ọnwụ, isi gị nwereike iso ya Akụkọ ga-amasị gị: Ihe ise ị ga-eme ma ọ bụrụ na esemokwu ezinụlọ na-emekpa gị Bayelsa-Kogi elections: "Ntuliaka a enwebeghị mpụ dị ka ya- Ezeife" Ihe ise ị ga-eme ma ọ bụrụ na esemokwu ezinaụlọ na-emekpa gị
[ "Azụmahịa nke kọmpụta", "Naijiria", "Ịkpa arụ nke cyber", "Nchekwa ndị ụwe ojii" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50564323
Aha ndị na-egosi na Igbo kwenyere n'ịlọ ụwa
Ịlọ ụwa bụ nkwenye Igbo nke ukwu mana kedụ ụfọdụ aha Igbo na-aba iji gosipụta nkwenye a?
2019-11-27T05:23:29Z
Igbo Reincarnation: Aha ndị na-egosi na Igbo kwenyere n'ịlọ ụwa
Nwaanyị na nwa ya Nkwenye Igbo gbasara ala mmụọ dị ọtụtụ nke gụnyere ịnọ ụwa, amosu nakwa ọgbanje. Ịlọ ụwa dịka J.A.S. Nwankwo bụ onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara omenala Igbo kọwara pụtara nkwenye na mmadụ nwụọ, ọ na-alaghachite n'ụwa bie ndụ ọzọ. Gịnị kpatara ndigbo ji kwụsị ịgụ ụmụ ha ụfọdụ aha? Ihe ndị ị kwesịrị ịma tupu ị lụọ nwaanyị Igbo Otu ụzọ Igbo si egosipụta nkwenye a bụ site n'ịgụ mmadụ aha gosiri na ọ bịara ụwa mbụ, nwụọ ma laghachite. Mana tupu a baa aha o nwere ụzọ esi a ma ma mmadụ a bịaghachiri ụwa nakwa onye ọ nọrọ ụwa. Etu e si achọpụta ma mmadụ abịaghachiri ụwa Maazị Nwankwo kwuru na "o doro anya na Igbo kwenyere na ịlọ ụwa". Maazị Nwankwo nyekwara ụzọ dị icheiche esi achọpụta ma mmadụ abịaghachiri ụwa nakwa onye ọ nọrọ ụwa. Ihe ị kwesiri ịma maka okpueze ala Igbo Nsibidi: Akara ochie e jiri mara ndị Igbo - A mụọ nwa ọhụrụ a ga gbaa afa maọbụ gbaa agụ n'ụlọ dibia ịmaata onye ọ lọrọ. - Apa na-adị nwa ọhụrụ n'ahụ yiri nke onye ọ nọrọ ụwa bu n'ahụ ya. - Omume maọbụ njirimara onye ahụ nwụrụ anwụ dịka ọrụsị aka maọbụ ọrụsị ụkwụ. - 'Ike ekpe' ya bụ ihe ndị onye ahụ nwụrụ kwuputara na ndụ mbụ ya ọ ga-eme ma ọ laghachite ụwa ọzọ. Aha ndị na-egosi echiche na mmadụ nọrọ ụwa Ọnọchie pụtara Nnaanọchienobi. Nnamdi pụtara Nnamdindụ. Nnennia maọbụ Nnenna. Nnedi pụtara Nnem dị ndụ be m. Obele - Ọ bụrụ na mmadụ lọọ gị, a ga na-akpọ gị Obele aha onye ahụ dịka 'Obele Okeke' maọbụ 'Obele Mgborie'. Nwannia pụtara Nwa nna ya maọbụ Nwanyị nna ya. Nwadinobi pụtara Nwa bịara n'obi be nna ya. Nwabia maọbụ Nwabiara pụtara Nwa bịara ụwa be nna ya. Obiekunyie pụrụiche n'ihi na ọ bụ ndị agbụrụ ha na-akwado imechi tupu a mụọ nwa ahụ na-aba aha nke a. Maazị Nwankwo kwuru na nkwenye Igbo n'ịnọ ụwa abụghị nkwenye nkịtị na ọ bụ ndụ ha na-ebi. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo? Witchcraft Conference: Ngagharịiwe emeela ka a gbanwee isiokwu ọgbakọ ahụ Ụzọ ọhụrụ ndị mmadụ si achọ ịcha ọcha
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Ọdị ka chikere", "Naijiria", "Abia Steeti", "Omenala", "Anambra Steeti", "Ụmụaka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50514452
Nwoke anwụọla ebe ọ gara ịzọpụta onye ọzọ
Ọtụtụ mgbe ka ndị mmadụ na-emerụ ahụ maọbụ nwụọ ebe ha na-enyere mmadụ ibe ha aka mana lee ka ị ga-esi gbanarị ọdachị a.
2019-11-27T11:45:27Z
Accident victim help: Etu ị ga-esi nyere mmadụ aka ghara igbu onwe gị
Ọkụ latrịk Onye ọkwọ ọgbatumtum anwụọla ebe ọ na-azọpụta nwoke kụrụ ụgbọala ya na poolu ọkụ latrịk. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Lagos steeti bụ Elkana Bala kwuru na ọkụ latrịk dọgburu onye ọkwọ ọgbatumtum ahụ aha ya bụ Abdullahi Hassan ebe ọ gara ịzọpụta nwoke ahụ nwere ọdachị a. Etu ihe mberede Okporoụzọ tara isi mmadụ isii n'Anambra state si mee Ihe mberede okporoụzọ ataala isi otu onye n'Enugu Agidi N'okwu Elkana, "Ọkụ latrịk dọgburu Hassan mgbe ọ zọrọ ụkwụ n'elu eriri ọkụ latrịk ahụ ụgbọala kuturu poolu ya." Onye na-azọpụta mmadụ na-ebuzo azọpụta onwe ya. Lee ihe ole na ole i kwesiri ịma tupu ịgbara gawa ịzọpụta onye ihe mberede ọbụla dakwasiri dịka onye ọkammụta n'ihe gbasara nchekwa si kwuputa. Jụọ onwe gị ma ibu ọkammụta n'ihe gbasara ihe mberede ahụ dakwasara onye ahụ. Ị bụrụgodi ọkammụta, yiri uwe nchekwa ga-eme ka ịgbanahụ imerụ ahụ n'ọdachi. Ọ bụrụ na ọ bụ ọdachị gnke ọkụ latrịk, ọ ga-adị mma ka ị kpọ ndị ọrụ ọkụ latrịk Ọ bụrụ ụgbọala na-agba ọkụ ,kpokuo ndị mmadụ ka ha nyere aka gbanyụọ ya Che echiche maọbụ ezigbo ọdachị ka ọ bụ nke e mere dịka 'arrangee' Yiri uwe aka ga-egbochị gị imetụ ọbara makana ị maghị ọrịa onye ị na-enyere aka bu. Ọ bụrụ na ịhụ ebe ọtụtụ mmadụ gbakọrọ na-azọpụta onye ahụ, kwụrụtụ gee ntị ka ị mata asụsụ ha na-asụ. Akụkọ ndị ga-masị gị Aha ndị na-egosi na Igbo kwenyere n'ịlọ ụwa. Tekinụzụ '5G network' a na-abịa ọ ga-agbanwe ndụ gị? Sheffield abụrụla anụ kpọrọ nkụ juru Man Utd ọnụ Ihe ise i kwesiri ịma maka amụ
[ "Naijiria", "ụlọ-ọrụ Latrik", "Mberede njem ụgbọelu", "Mmiri" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50580508
Iwu emegideghị nwa nwoke dị afọ 17 lụrụ nwaanyị n'Anambara- Ọkaiwu
Alumdinanwunye ụmụaka n'Anambara steeti ebulitela ndọrịtaụka ebe iwu Naijiria kwụ dịkao kwesiri ilu di maọbụ nwunye.
2019-11-27T19:31:26Z
Child marriage: Kedụ aha ole iwu kwuru ka alumdinanwunye na Naijiria?
Ụmụaka lụrụ onwe ha Onye ọkaiwu ekwuola na o nweghị iwu nwata nwoke dị afọ 17(iri na asaa) lụrụ nwaanyị dara dịka ọ bụ n'ụzọ omenala ka ha mere alụmdịnanwunye ha. Soshal midia nwuru ọkụ dịka akụkọ pụtara nke na-ekwu na ụmụaka abụọ lụrụ onwe ha na Nnewi Anambara steeti. Somto Nwachukwu, onye Obiofia Otolo Nnewi mere emume alụmdina wunye dn'ụzọ omenala, ihe dịka otu ọnwa gara aga, dịka ononye achọghị ka a kpọaha ya gwara BC Igbo. Kedụ uru maọbụ ọghọm dị n'ụmụnwoke ịlụ ụmụada n'etorughi afọ 18? Regina Daniels akpọọla okwu aha Nwaanyị alụghị di ọ ka ogbo ya lụrụ di enwe aṅụrị? " Amaghị ihe o ji buru ugbua ka ya bụ akụkọ na-ewu. O mere ihe karịrị otu ọnwa gara aga." N'ala Igbo, a na-alụrụ nwata nwoke a mụụ naani ya nwaanyị n'oge iji gba mbọ hụ na aha ezinaụlọ ya efughị, mana onye mgba ama bụrụkwa onye obi ọhịa kọwara na ọbụghị naanị Somto ka a mụrụ. Ọghọm dị n'ilụ di na nwata na Naịjirịa India: Idina nwunye maobụ di mmadụ abụghị njọ 'Ndị ụlọ anyị sị m ma alọtazina ụlọ ọzọ ma m ahụghị di' Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya: Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na o nweghị ihe ọjọọ dị ya, ebe ọtụtụ ya bụ ihe adabachaghị n'anya ya. Mana Ọkaiwu Chukwuemeka Eze nke Mahadum Nassarawa StateUniversity gwara BBC na "O nweghịkwa iwu o megidere." "Iwu Children and Young Person Law kwuru na nwa dị afọ iri na asaa etoola ị sị na ọ bụ dịmkpa." Eze gara n'ihu kọwaa na nke nwaanyị dị afọ 16 ka bụ nwata n'ihu iwu Naijiria. Gee ihe Ọkaiwu Eze kwuru n'uju: "Akwụkwọ ekweghị Somto agụ nke mere ka ọ kwụsị na JS 2." "O bidoro na-agwa ndị mụrụ ya na ọ chọrọ ilu nwaanyị." "O kwugidere , ha kwado ya ọ gaa lụta nwaanyị." Akụkọ ndị ga-amasị gị Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo? Witchcraft Conference: Ngagharịiwe emeela ka a gbanwee isiokwu ọgbakọ ahụ Ụzọ ọhụrụ ndị mmadụ si achọ ịcha ọcha
[ "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50585868
Ihe i kwesịrị ịma maka iwu okporoụzọ
Dịka onye ọbụla na-eme njem n'okporoụzọ lee iwu ndị a dị iche iche onye ọbụla ji ụgbọala kwesiri ịma.
2019-11-28T13:33:58Z
Nigerian Traffic Laws: Ihe i kwesịrị ịma maka iwu okporoụzọ
ụgbọla njem ụgbọla njem Mmadụ na ụmụ anụmanụ niile nọ n'obodo nwere ikike na ohere ịme njem n'okporoụzọ mgbe nakwa etu ọbụla masịrị ha. Mana e nwere iwu ndị na-echekwa usoro e ji eme njem n'okporoụzọ nakwa ndị ọ bụ ọrụ ha ihụ na ndị mmadụ rubere isi na ha. FRSC ezipụla ndị ọrụ 25,000 maka ihazi njem okporoụzọ n'oge a Ihe mberede okporoụzọ n'Awgu ataala isi mmadụ anọ A tụrụ anya na onye ọbụla na-agba n'ụzọ ga-erube isi n'iwu ndị a na-echekwa okporoụzọ ka ọ ghara ịnata ntaramahụhụ. Dịka ị na-akwado ime njem n'oge ekeresimesi a, ọ dị mkpa ka i buru iwu ndị a n'obi ka ị ghara ịnọ n'ụlọmkpọrọ rie osikapa ekeremesi gị. Ị ga-eke eriri oche ụgbọala Oche Ụgbọala nwere eriri nke e ji ekegide mmadụ n'ime ụgbọala ka ọ ghara ịkụ isi n'ihe ma ụgbọala ahụ kwụsị n'ike. Ọ bụ iwu na onye ọbụla bara n'ụgbọala ga-eji eriri a kegide onwe adịghị a ma ama maka ihe mberede okporoụzọ. Onye ọbụla na-emeghi nke adaala iwu. Ị ga-aghị ebu oke ibu Ụgbọala ọbụla nwere ọnụọgụgụ mmadụ ole maọbụ ibu ole o nwereike ibuli maka ịgba ọsọ dịka o kwesịrị. Ọ bụrụ na ị na-eme njem ma bunye ụgbọala ahụ ibu maọbụ mmadụ ole karịrị ya, ị daala iwu na-echekwa okporoụzọ. Nke ọzọ bụ i buru ibu mapụtara n'ụgbọala gị nke na-ekweghi ka i mechie ụzọ ụgbọala gị nke ọma. Ị ga-enwe akụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala Tupu ị malite ịkwọ ụgbọala, ị ga-abụ onye mara agba ma nweka akụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala, nwee akwụkwọ na-egosi onye nwee ụgbọala. Ị ga-enwekwa akụkọ ndị ọzọ na-egosi na ụgbọala gị dị mma ịgba n'ụzọ na ndị ọzọ dị iche iche. Ị ga-enwe ọkụ ụgbọala dị mma Dịka anya bụ ihe mmadụ ji ahụ ụzọ, ụgbọala ọbụla nwereọkụ nke na-enyere onye na-akwọ ya aka ịhụ ụzọ n'abalị. E nwere ọkụ ihu na nke azụ na-egosipụta nkọwa dị iche iche. Ọ bụrụ na ụgbọala gị e nweghi ọkụ ndị a, ị mara na ị daala iwu na-echekwa njem okporoụzọ. A ṅụla mmanya na-aba n'anya Ị bụ onye ịṅụ mmanya n'aba n'anya na-amsị? Buru ya n'uche na ị ga-aghị aṅụ mmanya ma ọbụrụ ị chọrọ ịkwọ ụgbọala maọbụ dịka ị na-akwọ ụgbọala. Onye ọbụla mere nke a adaala iwu okporoụzọ, o nwekwara ike inwe ihe mberede okporoụzọ nke nwereike ibute ọnwụ erughi eru. Iwu ndị ọzọ gụnyere: Agbala oke ọsọ n'okporoụzọ etu ekwesighi Ụkwụ ụgbọala gị niile ga-adị mma Ị ga-enwe ihe e ji agbanyụ ọkụ n'ụgbọala dgz Iwu ndị a niile abụghị i ji taa mmadụ ahụhụ kama ọ bụ iji zọọ ndụ mmadụ megide ihe mbere nwereike ịdapụta n'ihi erubeghi isi n'iwu ndị a Ya mere gbaa mbọ hụ na i rubere isi n'iwu ndị a ka gị na ndị ọrụ 'Federal Road Safety Commission (FRSC)' ghara itinye ụkwụ n'ofu traụza. Akụkọ ga-amasị gị:
[ "Ọrụ njem na ịtụrụndụ", "Naijiria", "Njem", "Njem nleta", "Njem" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50583998
Gaasị agbagbuola ụmụaka abụọ na Legọs
Ndị ọrụ gbatagbata na Legọs bụ LASEMA gwara BBC na e burula ozu ụmụaka ahụ bunye ezinaụlọ ha.
2019-11-28T18:44:50Z
Gas Explosion: Anwụrụ agbagbuola ụmụaka abụọ n'Ajegunle
Ndị ọrụ gbatagbata Na Legọs, gaasị gbara n'ụlọọrụ a na-ere gaasị egbuola ụmụaka abụọ ma merụọ mmadụ iri abụọ na atọ ahụ na Ajengunle Legos, dịka ndị ọrụ gbata gbata si kwuo. Ha kwukwara na a gbachiela gburgburu ahụ ịji malite nnyocha banyere ihe butere ya bụ ihe gbaranụ. E menyụola ọkụ na-agba n'ọdọahịa dị na Yaba Onyeisiala Muhammadu Buhari na-aga Equatorial Guinea N' aka nke ọzọ, Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-aga njem ọrụ na mba Equatorial Guinea echi. Buhari na-aga ebe ahụ ịnọchị anya Naịjirịa na nzụkọ mba ndị na-ebupu Gaasị mba ndị ọzọ. N'ofesi Mba Gana enyela ihe ruru mmadụ otu narị na iri abụọ bụ ndị mbịarambịara biri ọtụtụ afọ ikike ịbụ ndi ala ahụ. Onyeisiala ha bụ Nana Akufo-Addo gwara ndị ahụ ha gbaa mbọ hụ na ha emeghị ihe ga-ebutere mba ọhụrụ ha ajọ aha. N'egwuregwu, William Troost-Ekong na-agbara ndị Udinese nke mba Italy. Nne ya bụ onye mba Netherlands ebe nna ya bu onye Akwa Ibom steeti. Ọkwa Naịjirịa arịala ogogo anọ na ndekọ egwuregwu boolu nke FIFA mere na mba ụwa niile n'ọnwa Novemba Nke a pụtara na Super Eagles nọzi n'ọkwa iri atọ na otu n'ụwa nakwa ọkwa atọ n'Afrịka. Akụkọ ụwa n'otu nkeji Super Eagles: 'Ọnweghị ihe obiụtọ dị n'ọrụaka Gernot Rohr' - Fashanu Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles Onye bụbu otu n'ime ndị isi na Football Federation Board nke Niajirịa bụ John Fashanu sị na onweghị ihe na-eme ya obi ụtọ na ọrụ Gernot Rohr. Anyị nụrụ na ọ si na Rohr enweghị ike ịzụpụta ndị egwu bọọlụ ga abụ ọkaibe na mba Afrịka. APC Edo ka nọ n'ihu ọkụ Ihe na-ebe ka na-ebe na APC Edo state ka ha jụrụ na ha agaghị aga ọgbakọ ndị ngalaba nke Ọdịda anyanwụ pati ha kpọrọ. N'ozi ozipuru n'ụtụtụ Tọzde, onyeisioche pati ahụ n'Edo steeti bụ Anselm Ojezua sị na akpọturughị ha tupu e hibe ọnọdụ ya bụ ọkpakọ. Ortom emeriela an Benue N'ozi ozipuru n'ụtụtụ Tọzde, onyeisioche pati ahụ n'Edo steeti bụ Anselm Ojezua sị na akpọturughị ha tupu e hibe ọnọdụ ya bụ ọkpakọ. Gọvanọ Benue steeti bụ Smuel Ortom amaliela elu ka ụlọikpe mgbegharị sị ya chiri gawa. N'ikpe ha kpebiri ụbọchị Tọzde, ha bụ ụlọikpe wezugara akwụkwọ onye APC bụ Emmanuel Jime gbara ị sị na ya ekweghị na mmerị Inec nyere Ortom. Onyeisiala Benin Republic sị EU puo n'ala ha Onyeisiala Benin Republic bú Patrice Talon Gọmenti mba Benin enyela onyenọchịta anya EU na mba ahụ ụbọchị mbu n'ọnwa Disemba ka ọkwara lii n'mba ahụ. Ha sị na Ambassador Oliver Nette na-etinye ọnụ n'okwu agbasaghị ya bụ nke nwere ike ịbute ọgbaaghara na be ha. Ụmụnwoke 47 agọrọla ụkwụ na aka ha n'ebubo banyere mmekọ ahụ nwoke na nwoke nke bụ agwa megidere iwu Naịjirịa. Iwu Naịjirịa kwuru na onye ikpe mara maka ihe a ga-aga mkpọrọ afọ 14. 'Anaghị ede nwoke na-ebi ibe ya n'ihu' Ndị uweojii n'Abia anwuchiela nwoke isi na-edina onwe ha Ile anya n'ara nwaanyị ọ na-agbati ndụ nwoke? Ụmụnwoke ndị pụtara n'ụlọikpe dị na Legọs ụbọchị Wenesde bụ nke 28 n'ọnwa Nọvemba so n'ime 57 ndị uweojii nwụchiri n'afọ 2018 n'obodo Egbede dị na Legọs. Ndị uweojii sị na a na-eche ndị iyi ọnụ maka ịba n'otu "ụmụnwoke na-edina ibe ya", mana ndị a eboro ebubo sị na ọ bụ emume ncheta ọmụmụ mmadụ ka ha gara. Ikpe bụ nke a ga-eji nwaa iwu megidere alụmndị maọbụ mmekọ nwoke na nwoke ehibere mgbe Goodluck Jonathan na-achị Naịjirịa n'afọ 2014. Nhibe iwu a butere Jonathan ajọ aha n'etiti ndị na-achị mba ụwa ọkachasị David Cameron nke mba Briten. Onwebeghi onye a mara ikpe site n'iwu a, mana ụfọdụ ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye dịka "Human Rights Watch" sị na-eji ya amaja ndị mmadụ ma nara ha ego n'ike. Ndị na-ekpe ndị a ikpe gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na ha ga-achọ ịkpụta mmadụ iri ndị ọzọ so n'ime mmadụ 57 amara ikpe ka ha bịa soro zaara ọnụ ha. Ikpe ndị a ga-amalitekwa n'ụbọchị 11 nke ọnwa Decemba. Ndị Customs mba ọdịda anyanwu zukọrọ maka bọda Ndị isiọrụ Customs Ọdịda anyanwu mba Afrịka e nweela nzụkọ N'Abuja ụbọchị Tuzde maka okeala Naịjirịa e mechiri ọnwa atọ gara aga. Minista na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed na-akọwa na ha ekwekọrịtabeghị ịmeghe ya maka na mba ọdịda anyanwụ ndị ọzọ anaghị edowe iwu ụtụisi ha. Najirịa na-esi ọnwụ ịlawa utuisi n'elu ngwaahịa ọbụla na abata be ha. Okpunnabụenyi, peteri na ihe ndị ọzọ a na-atụbata Naijirịa na-emepụta Ndịisi Customs mba atọ a bidebere onwe ha zukọtara itinye ọnụ na ya bụ okwu bụ nke Naịjirịa sị na ọ na ebutere ha njọ ahịa. Cheta n'ọnwa July, Naịjriịa tinyere aka na akwụkwọ maka nkwado azụmahịa n'etiti mba atọ a bụ agbata obi. Mana Naịjrịa n-atụ egwu na ndị ejizi be ha mere ikpoahịhịa ebe ngwongwo sị mba ndị ọzọ na enubata na be ha maghara ịtụ ụtụisi, ma na-akụkwara ndị ọrụaka Naịjriịa ọrụ. Naịjrịa sị na ha ga-emechi okeala a ruo ọnwa Jenuwarị, ebe ha ritagoro uru ruru pasenti iri atọ maka mmanụ fuel ndị mmadụ na-ezupu, dịka Lai Mohammed kwuru. Trump etinyela aka n'akwụkwọ maka Hong Kong Ka anyi ga na mba mba Amerịka ebe Onyeisiala Donald Trump tinyere aka n'akwụkwọ ga-eme ka mba Amerika na-etinye anya na ikike diiri onye na Hong Kong. Ebe ndị ọchịchị China na Hong Kong na-akatọ ya bụ iwu, ndị na-azọ mnwereonwe na Hong Kong sị ọ magburu onwe ya. Liverpool a na-agba ọnyụpaa? N'egwuregwu, Liverpool bụ ndị bu iko Champions League nke afọ gara aga ka na-akpụakpụ na sizin a site na otu ọkpụ onye nawa onye nawa ha na ndị Napoli gbara onwe ha ụnyaahụ. Nke mere na Liverpool abanyenwughị gba nke ebe otu egwu boolu iri na isi ga-achipụ ya. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji
[ "Okike", "LGBT", "Mmekọ nwoke na nwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50593781
Lee ihe nri na-ada na-ahịa ugbua e mechichara 'border'
Mmechi gọọmenti mechiri agbata Naijiria na ụfọdụ mba emeela ka ọnụ ahịa ihe oriri ụfọdụ rịa n' elu ọjị.
2019-11-28T18:45:29Z
Border Closure: Lee ihe nri na-ada n'ahịa ugbua
Ihe oriri Ụmụ afọ Naijiria na-eti mkpu dịka ọnụ ahịa ọtụtụ ihe gụnyere ihe oriri rịrị elu ọjị dịka gọọmenti etiti mechiri agbata Naijiria na mba ndị ọzọ ebe ahịa ndị a si abata. 'Rice akọọla n'ahịa n'ihi mmechi border' - Ndị ahịa Ngwa ahịa m ka tọrọ na 'Seme Border' - Onye na-atụbata ahịa Ihe oriri dịka osikapa, mmanụ ọpapa, anụ ọkụkọ na ngwa e ji esi nri dịka tomato n'adazị ọnụ ugbua n'ahịa karịa etu ọ dị na mbụ. Gọọmenti onyeisiala Naijiria bụ Muhammad Buhari ekwuru n'ezie na mmechi e mechiri agbata Naijiria na mba dị ọzọ butere ihe ịda oke ọnụ. Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed bụ onye kwuru nke a ka e nwechara ọgbakọ ndị imezi gọọmenti etiti a kpọrọ FEC n'aha ịchafụ na nso nso a. Nweenụ ndidi maka 'border', ihe dị ọkụ ga-ajụ oyi - Osinbajo Okpunnabụenyi, peteri na ihe ndị ọzọ a na-atụbata Naijirịa na-emepụta Lee ọnụ ahịa ụfọdụ ihe oriri tupu emechie ụzọ na ugbua e mechiri ụzọ: Osikapa A na-ere otu osikapa ihe dịka puku naira iri na atọ rue puku naira iri na ise (N13,000-N15,000). Mana ugbua e mechiri ụzọ, akpa osikapa na-adazi puku naira iri abụọ na-asatọ. Ndị na-ere osikapa kwuru na ụfọdụ ha anaghị ahụ osikapa ha ga-azụta n'aka ndị na-akọ ugbo osikapa na Naijiria. Anụ ọkụkọ Tupu gọọmenti emechie ụzọ, a na-ere anụ ọkụkọ 'fridge' otu puku naira(N1000) maka otu kilo na Legọs. Mana ugbua, ihe anụ ọkụkọ e tinyere na 'fridge' na-ada bụ otu puku, narị anọ(N1400). Tomato Tomato sokwa n'ihe ndị ọnụ ahịa ha rịrị maka mmechi agbatta Naijiria na mba ndị ọzọ. Iji maa atụ, e reburu otu kilo tomato N6500 ma ugbua ọ bụzị N8070. Mmanụ ọpapa Mmanụ ọpapa na-adabu puku naira itoolu na narị ise(9,500) tupu gọọmenti emechie agbata Naijiria na ndị mba ọzọ. Ugbua, ọnụ ahịa mmanụ ọpapa bụzị puku narị naira iri na otu (11,000). Azụ friji A na-ahụbu azụ friji dịka nri ndị ogbenye Ihe azụ friji na-ada tupu e mechie ụzọ bụ otu puku maka otu kilo. Mana ugbua, ọnụ ahịa ya arịruola otu puku , nari naira abụọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị Iwu emegideghị nwa nwoke dị afọ 17 lụrụ nwaanyị n'Anambara- Ọkaiwu Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo? Witchcraft Conference: Ngagharịiwe emeela ka a gbanwee isiokwu ọgbakọ ahụ Ụzọ ọhụrụ ndị mmadụ si achọ ịcha ọcha
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Togo", "Akụ na ụba", "Ghana", "Niger" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50535804
Etu Akanu Ibiam si bụrụ onye a ma ama ugbua
Ọtụtụ ebe ka ị ga-ahụ aha nwoke a na Naịjirịa, mana kedụ ihe mere o ji bụrụ onye agaghị echefu echefu?
2019-11-29T07:19:36Z
Akanu Ibiam: Nwoke ọma zuru ụwa ọnụ
Akanu Ibiam Aha ya dị n'ọdọụgbọelu, dịrị n'okporoụzọ nakwa ebe ndị ọzọ, mana onye ka Maazị Akanu Ibiam bụ? Ọtụtụ ndị ahụla aha nwoke a ma n'ụlọakwụkwọ nakwa ebe ndị ọzọ, mana ha amaghị maka nwoke a so n'otu okeosisi ndị Igbo. Gịnị ka ị ma maka Chinua Achebe debanyere aha ya n'obi ndị Naịjirịa? Nna Odumegwu Ojukwu kpara akụ eriwe agwụ agwụ Ihe ise i kwesịrị ịma maka Alvan Ikoku A bịa n'ala Igbo kpọo aha ndị tozuru etozu mgbe gboo ghara ịgụnye ya n'ime mmadụ iri mbụ a kpọpụtara, mara na a gụwabeghi. Makana taa bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Nọvemba 2019 gaara abụ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya maọbụrụ na ọ ka dị ndụ, BBC Igbo ga-akọwara gị ihe ị kwesịrị ịma maka ya. Akanu Ibiam Airport Enugwu Ihe ị kwesịrị ịma maka Akanu Ibiam A mụrụ ya n'obodo Unwana dị n'Afikpo dị n'Ebọnyi steeti n'ụbọchị 29 nke ọnwa Nọvemba, afọ 1906 Ọ gara akwụkwọ sekọndrị na Hope Waddell Training Institute ebe ya na ndị dị ka Nnamdi Azikiwe, Alvan Ikoku, Eni Njoku nakwa ndị ọzọ gara akwụkwọ. Ọ gakwara Kings College tupu ọ gaa gụọ maka Ahụike na University of St.Andrews dị na mba Skọtlandị Ọ bụbu gọvanọ ebe a ma dịka "Eastern Region" O mechara bụrụ onyeisi ụlọakwụkwọ Hope Waddell ahụ, n'afọ 1957, ruo afọ 1959 oge e mere ya onyeisi mahadum Ibadan Oge ọ dị ndụ, ọ katara ụka ọfụma, mere e ji mara ya amara ma n'ụka Church of Scotland. O nwetakwara ọkwa n'ọgbakọ ndị ụka na Naịjirịa O nwetara nturuugo Order of the British Empire O si na ihe gbasara agụmakwụkwọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ihe e ji anụ aha ya ugbua Ọ rụrụ dịka onye ọchịchị ime obodo, n'ụlọomeiwu nke mpaghara ọwụwa-anyanwụ Ka Naịjiria nwetara nnwereonwe n'aka ndị mba Briten n'afọ 1960, e mere ya gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ ebe ọ nọ ruo afọ 1966 mgbe ndịagha ji ike weghara ọchịchị, mere ka Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ onye agha Naịjiria mgbe ahụ chụpụ ya n'oche ọchịchị Ibiam nyerela ndị Biafra aka dị egwu mgbe a na-alụ agha; site n'isi n'aka ndị ọ ma n'ụka na-ewetara ha ihe enyemaka n'ime abalị O ji maka enyemaka ndị Briten na-enyere ndị Naịjiria n'agha ahụ kwuo sị na ọ gaghị azazị agha Bekee ya bụ 'Francis' Ọ nwụrụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị n'afọ 1995, mgbe ọ dị afọ 88 A gụrụ ọdọụgbọelu dị n'Enugwu steeti aha ya, ụzọ dị n'Ụmụahịa nakwa n'Ebọnyị, mahadum dị n'Ebọnyị bụ ebe o si, nakwa ọgbọegwuregwu dị n'ime mahadum Nsụka. Akụkọ ga-amasị gị: Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50386381
Gịnị ka ị nụrụ maka Mbonu Ojike?
Aha ya dị n'ọtụtụ akụkụ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ, mana lee ihe anyị ma maka nwaafọ Igbo a.
2019-11-29T09:10:34Z
Mbonu Ojike: Ihe ị kwesịrị ịma maka dimkpa Igbo a
Mbonu Ojike Gịnị ka ị ma maka Maazị Mbonu Ojike? Kedụ nke a ga-akpọpụta nwoke a abụghị? Odeakwụkwọ? Ogụegwu? Onye nkuzi? Onye ndọrọndọrọ ọchịchị? Kedụ nke a ga-akpọpụta aka ya adịghị n'ime ya? Gịnị ka ị ma maka Chinua Achebe debanyere aha ya n'obi ndị Naịjirịa? 'Zik of Africa'; Nwoke ndị Igbo ji eme ọnụ Gịnị ka ị ma maka Eni Njoku; nwaafọ Igbo isi ya na-apụ ọkụ n'agụmakwụkwọ? Ojike so na ndị Igbo nwere oke ọgụgụ isi mere ka a mara ya amara oge ọ dị ndụ. E mechara mara ya maka okwu ọ na-ekwukarị bụ "Boycott all boycottables" na Bekee, nke pụtara "gọpụ onwe gị ma ọ bụrụ na ọ dabaraghị gị". Lee anya ka BBC Igbo kọwaara gị maka ya. Ihe ị kwesịrị ịma maka Mbonu Ojike: A mụrụ ya n'afọ 1914, n'Arọndịizuogụ dị n'Imo steeti O kwetara na nwoke ịlụ karịa otu nwaanyị, mere ka ọ lụọ nwunye abụọ Dịka akụkọ si kwuo, ọ banyere otu a na-akpọ Ogboni, ebe ọ nọ ruo oge ọnwụ Ọ gụrụ akwụkwọ na Naịjiria, kuzikwaa nkuzi ma gaa ụlọakwụkwọ maka ndị chọrọ ịbụ ndị nkuzi O mechara gụọ akwukwọ na mba Amerịka, na mahadum "Lincoln University, University of Illinois nakwa Ohio State University", ebe ya na ndị dị ka Ozumba Mbadiwe gụkọrọ akwụkwọ ma bụrụ enyi Ka ọ nọ na mba ofesi, o dere ụfọdụ akwụkwọ gbasara omenaala Afrịka nakwa gbasara ịkpa oke ndị ọcha na-akpaso ndị isi ojii Ị ma na ọ gụkwara egwu? Ọ bụ ihe ndị Bekee na-akpọ "choirmaster" oge ọ na-akuzi nkuzi, ma na-akpọkwa ụbọ "piano" O dere ozi mwute gbasara ọnwụ mmadụ 21 na-egwuputa unyi ndị ọcha gburu n'Iva Valley dị n'Enugwu O jighi Afrịka egwu egwu, nke bụ na onye ma ya ma na ọ ga-ebu ụzọ họrọ ihe ọbụla bụ njirimara Afrịka dịka ejiji, nri, egwu, mmanya ngwọ nakwa ihe ndị ọzọ, tupu o kwute okwu nke Bekee. Maka etu ihe gbasara Afrịka si anụ ya ọkụ n'obi, o kwetara ịbụ osote onyeisi otu pati National Council of Nigeria and the Cameroons (NCNC) bụ nke Herbert Macaulay hibere, ebe ọ zọrọ ọkwa ma nweta oche ịnọchite anya Legọs steeti n'ụlọomeiwu. N'afọ 1951, e mere ya osote 'Mayor' nke Legọs steeti ebe ọ nọ ruo afọ 1953 mgbe ọ nwetara oche n'ụlọomeiwu nke mpaghara ọwụwa-anyanwụ Ọ rụkwara dịka Minista na-ahụ maka Ọrụ nakwa nke na-ahụ maka Akụnaụba, n'afọ 1954; ebe ọ nọ ruo afọ 1956 Ị gaa Owere, ị ga-ahụ ụzọ a gụrụ aha ya n'Ikenegbu, nakwa n'Ụmụahịa nakwa na Surulere dị na Legọs, ya na Fegge dị n'Ọnịcha Ọ nwụrụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Nọvemba nke afọ 1956, ka ọ dị naanị afọ 42. Akụkọ ga-amasị gị: Etu Akanu Ibiam si bụrụ onye a ma ama ugbua Arsenal achụọla Emery ọsọ mgbada Akwụkwọ nsọ amachighi 'plastic surgery' - Tony Rapu Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-50599155
Ihe mere Gọvanọ Umahi ji sị ka ndị mmadụ bịa natagharị 'C of O' n'Abakaliki
Kọmishọna Ebonyi steeti akọwaala ihe dị na usoro idebanyegharị aha ala dịka gọọmentị ha siri kwuo.
2019-11-29T11:14:05Z
Ebonyi Property Re-certification: Gọvanọ Umahi sị ka ndị mmadụ bịa natagharị 'C of O' n'Abakaliki
Dave Umahi nke Ebonyi steeti Gọọmentị Ebonyi steeti enyela iwu ka ndị ọbụla nwere ụlọ maọbụ ala n'Abakaliki, isi obodo steeti ahụ were ọsọ bịa denyegharịa aha ha na kọmputa ha zụtara ọhụrụ. Gọvanọ Dave Umahi bụ ọnye kwuru nke a ka ọ gara ịgbape kọmputa ọhụrụ ọ zụrụ maka nke a sị na ọ dị mkpa na onye ọbụla nwere ala maọbụ ụlọ ga debe aha ha. E nyela Ebonyi Steeti ikike ịrụ ọdọụgbọelu nke ha Ụmụnwaanyị Ebonyi state Nigeria enweghi ike ichefu aha ha 'Gọvanọ Umahi gbahapụrụ anyị na mba ofesi' Na nkọwa ya, kọmishọna mgbasa ozi dị n'aka bụ Uchenna Orji kwuru na atụmatụ a ga-enye aka ka usoro azụmahịa na mkpata ego malite ị ga were were. Orji kwuru na atụmatụ a ga-eme ka ihe gbasara okwu ala gbaa n'anwụ nke bụ na onye ọbụla ga-ahụ ya ebe ọbụla onye ahụ nọ n'ụwa. Ọ sị na nke a ga-eme ka onye ọ bụla chọrọ ịzụ ala mata nke bụ ya na nke abụghị ya maka na aha ndị nwe ala ahụ ga-egosi na kọmputa". Ọ ga-emekwa ka ndị mmadụ ghara ịgo ala ebe ọwa mmiri kwesiri ịga maọbụ ebe gọọmenti mapụtara maka ọrụ ha. Uchenna Orji sị na atụmatụ a ga-eme ka ịchụnta ego gawa were were n'Ebonyi steeti Ya bụ kọmpụta ga-egosikwa ụdị ụlọ ekwesiri ịrụ ebe dị iche iche na isiobodo ahụ. Orji sị na atụmatụ a "ga-achụpụ ndị omekome na agbaọsọahịa aka n'ọrụ ma mee ka ịzụ ala n'Abakiliki gawa were were". Nke ka nke bụ na ọ sị na ya bụ atụmatụ ga-emekwa ka gọọmenti nweta ego maka mmepe obodo. Mgbe anyị juru ego ole a gana akwụ were tinye aha na ya bụ kọmputa, Orji sara na ya amabeghị. Mana okwusiri ike na ihe a ga-eme ka ndị mmadụ nwee ike ịnweta akwụkwọ ikike ụlọ maọbụ ala bekee kpọrọ "Certificate of Onwership" (C of O) na akwụkwọ ala ndị ọzọ nkwa nkwa. Ọ sị na nke a ga-enyere ha aka ibita ego n'ụlọakụ ma onye chọọ ime otu ahụ. Ndị bị n'Abakaliki na-atụ egwu na ihe a bụ ohere gọmenti ji chọọ ị napụ ndị mmadụ ala maọbụ ụlọ ha. Otu onye na-achọghị ka akpọọ aha ya sị na 'gọọmentị chọrọ iji ụzọ ahụ napụ ndị mmadụ ego". Ihe dị mkpa pụtara na nrụrịtaụka Ebonyi steeti Ihe mere gọvanọ Umahi ji nye onye mgbasa ozi ya ọsọ Ọ bụ eziokwu na Ebonyi esoghi na Biafra? Ọ rụrụụka na-onweghị ka emecha ihe dị n'ime ya ka ego ghara ịpụ mmadụ n'ahụ. Ọ sịrị na ọ kwadoghị ya bụ ihe maka anaghị agba aka ahụ nwata eze. Akụkọ ga-amasị gị Ọnọdụ Arsenal na Manchester United bụ zi a gba e kpere chi' Lee ihe nri na-ada na-ahịa ugbua e mechichara 'border' Gaasị agbagbuola ụmụaka abụọ na Legọs
[ "Naijiria", "Ebonyi Steeti", "Akụ na ụba" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50584003
Arsenal achụọla Emery ọsọ mgbada
Otu egwuregwu Arsenal achụọla onye nchịkọta ha bụ Unai Emery.
2019-11-29T13:03:49Z
Unai Emery na Arsenal agbaala alụkwaghịm
Unai Emery Arsenal ji ọnụọgụgụ 19 nọdụ n'azụ ndị na-achị ọgbọ Premier League bụ Liverpool Arsenal achụọla onye nchịkọta ha bụ Unai Emery sị ya kwakọrọ pụọ maka na ọ naghị eme nke ọma. Onye kwuru nke a bụ Stan Kroenke so n'otu n'ime ndị nwe Arsenal n'ime ozi o wepụtara n'ehihie taa. Tottenham esepụla Mauricio Pochettino oche n'otele Arsenal ewerela 'chizoba' zaa aha nna ha Etu ọ sọrọ ụwa ya mee, Arsenal gba aka iko n'afọ a Ha sị na Freddie Ljunberg ga-anọchitụ anya nwa mgbe nta ruo mgbe ha ga-enwete onye ọzọ dịka onye nchịkọta n'uju. Unai Emery bụbu onye nchịkọta Paris St-Germain na Sevilla maburu ọkwa ịchịkọta Arsenal n'ọnwa Mee afọ 2018. Ọnọdụ Arsenal na Manchester United bụzị agba ekpere chi Igbo sị 'ma agwọ emeghi ihe o ji bụrụ agwọ, ụmụaka ewere ya kee nkụ', nke a bụ ọnọdụ Arsenal na Man. United n'asọmpi Europa. Dịke Ịngland abụọ a gbara nkịtị ka 'ụmụaka' abụọ dịka Eintracht Frankfurt na Astana gbaa ha ukwu n'ala ụnyaahụ. Ekwe ndị Lyon akụọla Arsenal n'isi Everton abọkasịala Man United ka ọkụkọ 'Easter' N'agbanyeghi na Arsenal nọ n'ụlọ ha 'ọgbọegwuregwu Emirates' ma buru ụzọ nye ndị Frankfurt goolu na nkeji 45 site n'aka Pierre-Emerick Aubameyang. Ha nọkwa ebe ahụ na-ele anya mgbe Frankfurt si n'azụ saa goolu ahụ ma nyekwa goolu ọzọ bụ nke ha ji merie Arsenal. Goolu abụọ ndị Eintracht Frankfurt ji merie Arsenal si n'aka Daichi Kamada n'ime nke 55 na 64 n'ụsoro. N'aka nke ọzọ Manchester United bụ ndị Astana lere ọbịa, bu ụzọ nye Astana goolu site n'aka Jesse Lingard na nkeji 10. Mana Dmitriy Shomko nke Astana siri ọnwụ ma saa goolu ahụ Manchester United nyere na nkeji 55. Site mgbe ahụ gawazie Astana kwanyere Man. United ọkụ n'ike nke mere Di'Shon Bernard onye Man. United ji nye onwe ha goolu na nkeji 62. Nke a mere Astana ji were ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Manchester United na ngwụcha asọmpi a. Mmeri a e meriri Arsenal na Manchester United e meela ka ọnọdụ ndị nchịkọta ha bụ Unai Emry na Ole Gunnar Solskjaer bụrụ 'A gbaa e kperechi'. Ndị uweojii gara n'ụlọ agadi nwaanyị wee hụ ozu di ya n'ime 'freezer' Ndị uweojii gara ịza oku na be otu nwaanyị dị afọ 75 hụru na ọnwụọla mana nke tụrụ ha n'anya bụ na ha hụrụ ozu di ya n'ime ntụ oyi. Ndị uweojii sị na ha na-eche na aka mmadu adịghị n'ọnwụ nwaanyị ahụ aha ya bụ Jeanne Souron-Mathers di afọ 75. Ha sị na a hụru ya bụ nwaanyị ebe edina n'ala n'ọnwụ, mana ọ bụ ozu di ya ka ha che na ọkwụghi ọtọ makana o nọọla n'ime ntụ oyi ahụ afọ. Onye uweojii aha ya bụ Jeremy Hansen na mpaghara "Salt Lake City" sị na ya bụ ihe na "esi isi. Agbanyeghi nke a, ndi uweojii si na ha amaghị ma aka nwaanyi ahụ ọ dị n'ọnwụ di ya. Ndị ọgbataobi ha sị na otela ha hụrụ nwoke ahụ. Ụfọdụ sị otu afọ ebe ndị ọzọ sị na oruola afọ iri na otu. Burkina Faso: Mba Amerịka sị ka ndị be ha nọ mba a kpọla ụmụ ha Mba Amerịka na-ekwuola na mmadụ niile dị afọ iri abụọ na otu gbadawa na-arụ ọrụ maọbụ na buru nwa onye ọrụ na ụlọ mmekọ ha na Burkina Faso kwakọrọ lawa. Nke a na-abịa dịka ha sị na ọnọdụ nchekwa na mba ahụ. N'ime akwụkwọ mgbasaozi ha wepụtara,ndị na-anọchịte anya Amerịka na Burkina Faso sị agbanyeghi na onweghi ihe ha nwereike rụtụ aka na ọ bụ ya kpatara ihe a ha kwuru, ọnọdụ nchekwa na ya bụ mba eruola ebe ọ gaghi amasị ụmụaka ịnọ n'ụlọ ọrụ ha. Ndị ọrụ ndi ọzọ ka ga-anọ. Nke a na-abịa dịka mba Amerịka wepụtara ndụmọdụ o nyere ndị be ha, nke sị ha gbanri ịga mba Burkina Faso maka mkpa mkpa ndi oyi ndu egwu na-akpa na ya bụ mba. Ndi oyi ndu egwu na-enyue ezigbote nsogbu na mba ahụ nke gunyere ị na-agagharị na-achọ ndị ha ga-awakpo.
[ "Islamic State group", "Amerika", "Manchester United", "Bọọlụ", "Arsenal", "Burkina Faso" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50584006
Otu onye anwụọla na mwakpo dara na London Bridge
Ndị uweojii na-ekwu na o doola ha anya na ọ bụ ndị oyindụegwu kpara mkpa mkpa a.
2019-11-29T17:45:53Z
London Bridge Incident: Otu onye anwụọla na mwakpo a
London Bridge Otu onye anwụọla ebe ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ na mwakpo mere na London Bridge nke mba Briten. Ka ọ dị ugbua ndị uweojii na mba ahụ na-eme nyocha akpọọla ya mwakpo otu ndị na-eyi ndụ egwu. Boris Johnson abụrụla Praịm Mịnịsta Briten Nigeria na ụlọọrụ P&ID agala ikpe udo na UK Praịm Minista mba ahụ bụ Boris Johnson ekelela ndị ọrụ gbata gbata maka enyemaka ha ma zigara ndị merụrụ ahụ ozi itiakanobi. Okporo mmanụ ọhụrụ na-abịa Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na a ga-ebido ọrụrụ okporo mmanụ agbịdị ga-esi Ajaokuta dị na Kogi steeti rue Kano. O kwuru nke a n'ọgbakọ mba ndị na-ebupu mmanụ agbidị nke na-eme ugbua n'Equatorial Guinea. Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a Akwụkwọ nsọ amachighi 'plastic surgery' - Tony Rapu Ụmụnwaayị ụfọdụ na-etinye ihe ike ka ewere chọọ mma Onye ama ama n'atụmatu inyere ndị nwere nsogbu aka bụkwa ukọchukwu bụ Tony Rapu enyerela ndị mmadu ihe ha ga-eji mee mkpọtu na soshal midia Ụkọchukwu Rapu sị na akwụkwọ nsọ ndị ofufe kraịst akatọghị ndị mmadụ ime ha Bekee kpọrọ "Plastic Surgery". Dọkịnta Bumbum: Aka akparalanụ dibia otele ukwu 'Lamborghini' Mercy abụrụla Ugoeze Big Brother Naija 'Achọrọ m ịwepụ otele m gotere egote' Mana, ọ sịkwa n'ọbụ mma nke mụọ ka mma. Rapu sị na ihe mere bụ na o nweghi ihe o chere dị njọ ma mmadụ chọrọ mma maọbu gbanwe onwe ya. Ọ bụ n'akara Instagram ya ka Ukọchukwu Rapu tinyere okwu a. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:
[ "United Kingdom", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50565495
West Ham ejirila 'hammer' kpọọ Chelsea ntu n'isi
Ndị West Ham bịara na Stamford Bridge mebọọ Chelsea na-eleghi anya n'azụ.
2019-11-30T17:06:17Z
Chelsea vs West Ham: A kpọọla Chelsea ntu n'isi na be ha
Pedro Obi na-agbawa ndị na-akwado Chelsea ugbua maka etu ndị West Ham ji were ha gbụchara ọnụ. Goolu Aaron Cresswell nyere n'ime nkeji 48, zuru ịkpọnye ntu n'obi nakwa n'akpati ndị Chelsea, makana ha asatanwughi otu mkpụrụ goolu ahụ. Chelsea jụrụ na-agaghịzị agwọ ha ka abacha ọzọ Valencia amụwala Chelsea anya ka azụ Man Utd ejirila Chelsea gbụchachaa ọnụ gbụfuo Na nkeji 71, a gụfuru goolu Michail Antonio nyere, dịka e kwuru na aka metụrụ ya. Ndị Chelsea gbara elu gbaa ala, mana isi ha apụtaghị n'agbanyeghi nkeji ise e tinyekwuru n'egwuregwu ahụ a gbara na Stamford Bridge. Nke a bụkwanụ mmeri mbụ West Ham na-emeri Chelsea na Stamford Bridge n'ime afọ 17. Chelsea ga-ezute Aston Villa n'ụbọchị anọ nke Disemba, ma zutekwa Everton n'ụbọchị asaa nke ọnwa ahụ. Man City a na-akwọzị mmiri ka azụ? Ndị Newcastle enyeghi Manchester City ohere imebọ ha n'ọgbọegwuregwu St James Park ka ha lere ha ọbịa taa. Ha ji goolu na-asa onwe ha okwu, ghara imenye onwe ha ihere n'azụ ụlọ ha ka ndị Man City buteere ha egwu. Chelsea jụrụ na-agaghịzị agwọ ha ka abacha ọzọ Man City agwọọla Chelsea ka abacha Liverpool apịwaala Man City ọnụ ka ụdara ụgụrụ N'ime nkeji 22 e ji bido bọọlụ ka Raheem Sterling gbakara neetị Martin Dubravka, mana Jetro Willems sara ya na nkeji 25 iji sị ha 'kwanyere onwe ha ugwu o'. Man City megidere nweta goolu ọzọ na nkeji 82, site n'aka Kevin De Bruyne, mana Jonjo Shelvey sara ya na nkeji 88, iji sị ha 'gbara ọgwụ ha ṅụọ'. Onye lawa onye lawa ha gbatara, mere ka Man City nweta otu pọịntị n'ime atọ; ma mee ka ha nọrọ na pọịntị 29. Nke a mere ka Liverpool bụ ndị ha na ha na-azọ onye ga-anọ n'isi tebulu, jiri pọịntị 11 na-aga ha ugbua. Ha ga-ezute Burnley n'ụbọchị atọ nke ọnwa Disemba, ma zute oke iro ha bụ Manchester United n'ụbọchị asaa. Akụkọ ga-amasị gị: Otu onye anwụọla na mwakpo dara na London Bridge Ọ bụ atụmatụ ibite ego n'ofesi anyị gbajọrọ ka Buhari wetekwara ọzọ - Shehu Sani Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Egwuruegwu", "Manchester City", "Premier League", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50597418
Nri onye nwere nje HIV kwesịrị iri
Ụdịrị nri ndị a dị mkpa na onye ọbụla nwere nje HIV kwesịrị ị na-eri ha maka ndozi ahụ.
2019-12-01T05:09:34Z
World Aids Day 2019: Nri ndị ga-edozi onye nwere nje HIV ahụ
Mkpụrụosisi Na mmadụ na-arịa ọrịa HIV abụghị na a maala onye ahụ ikpe ọnwụ dịka ụfọdụ ndị na-eche na ụwa agwụla. Ihe dịrị onye ahụ ime bụ ịṅụ ọgwụ dịka dọkịta si tụzie aka ma rie ezigbo nri dịka o kwesịrị. Lee nri ogbenye 10 ọgaranya na-erizi Ụfọdụ nri ndị Igbo anaghị erikawazị Ụzọ ị ga-esi gbalahụ ibufe nwa ọhụrụ gị HIV N'emume iji cheta ụbọchị ọrịa HIV nke afọ 2019 a, BBC Igbo kpọtụrụ onye ọkachamara n'ihe nri bụ Amaka Ezeoke ka ọ kụziere ndị mmadụ nri ndị a kwesịrị ị na-eri. Ezeoke onye nwe ụlọọrụ 'Nutrifit Wellness and Consult' sị na o nweghi nri pụrụiche ha kwesịrị iri kama na ọ bụ iri ezigbo nri na mgbe o kwesịrị. Ọ gara n'ihu sị na ụdị nrị dịka ndị a ga-enyere onye ahụ aka; Mkpụrụosisi Ọ sị na onye nwere ọrịa HIV kwesịrị ị na-aracha mkpụrụosisi nke ọma nakwa n'oge niile, na ọ na-enye aka ibulite vitamin na mineral dị n'ahụ onye ahụ iji buso nje ahụ agha. Mkpụrụosisi ndị dịka oroma, ọkwụrụ Bekee, apụl, unere, ube, anyụ Bekee dgz, ndị dị mma na-abụghị ndị rere ere. Akwụkwọ nri O kwesịrị iri akwụkwọ nri nke ọma na-abụghị nke rere ere maọbụ nke e sigwọrọ esigwọ. Nke na-enyekwa vitamin na mineral n'ahụ. Akwụkwọ nri ndị a gụnyere ụgụ, tomanto, ọha, onugbu, kukumba na ndị ọzọ. Nrị ndị e siri n'ọkụ E ji akpụ maọbụ ọka na nrị ndị ọzọ eri ofe egusi Onye ahụ ga na-eri nri ndị e siri n'ọkụ nke ọma na-abụghị mgbe niile ọ na-eri nri eghere eghe. Nri ndị a gụnyere osikapa, ji, akwa, nduku, ofe na garrị, akwa, mmiri ara ehi dgz. Ọ gara n'ihu kwuo na onye ahụ kwesịrị ị na-eri nri e siri n'ụlọ ya na-agụkarịghị nke e siri n'ezi ọ zụrụ azụ. Nke ọzọ bụ na ọ ga-asapụ aka ya ọcha tupu ọ na-eri nri ọbụla ọ chọrọ iri. Ịṅụ ezigbo mmiri Dịka ahụ onye ọbụla chọrọ mmiri, etu a ka ahụ onye nwere ọrịa HIV chọkwara mmiri. Nke a pụtara na onye ahụ agaghị eji ịṅụ mmiri egwu egwu, o nwereike ịṅụkwa ihe ndị ọzọ nwere mmiri dịka mmiri a pịpụtara na mkpụrụosisi nke Bekee kpọrọ 'juice'. Gbaara nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị (Sugar) ọsọ Ọ bụghị nnu niile ka a na-eri eri Ọ sị na onye nwere ọrịa HIV ekwesịghị iri nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị makana ọ na-egbu mkpụrụobi onye ahụ. Belata oke abụba na mmanụ N'agbanyeghi na abụba na-enye ike n'ahụ, ọ bụghị ya mere ka onye na-arịa ọrị HIV ga-eji rie ya nke ukwuu. O kwesịrị ibelata etu o si eri ya maka ọrịa mkpụrụobi. Ezeoke gara n'ihu nye ndị nwere ọrịa HIV ndụmọdụ ka ha na-emegharị ahụ kwa mgbe kwa mgbe, makana ọ na-enye aka imezi ahụ. Ọ sị na nke kachasị mkpa bụ ka onye ahụ ṅụọ ọgwụ ya dịka o kwesịrị, rie ezigbo nri dosa aka ya na onwe ya ọcha ma megharịa ahụ nke ọma. Na onye ọbụla na-agbaso usoro a ga-enwe ezi ahụike nke na-agaghị egosi na o nwere ọrịa HIV. Akụkọ ga-amasị gị: West Ham ejirila 'hammer' kpọọ Chelsea ntu n'isi E weghachịtala osisi si n'akwa Jesus dinara n'ime ya Otu onye anwụọla na mwakpo dara na London Bridge Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Nri", "Nchekwa nrị", "Nrị na-edozi ahụ", "Ahụike", "HIV/Aids", "World Health Organization (WHO)" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50619961
Uru ịrọ ajọ nrọ bara gị
Ajọ nrọ ị rọrọ nwereike ime ka oke ụjọ belata n'ime gị ma ị teta ụra.
2019-12-01T09:36:31Z
Sleeping habit: Nrọ ọjọọ a ga-egbochinwu ụjọ ma mmadụ mụrụ anya?
Ụra Ọ bụrụ na ị rọrọ nrọ ọjọọ n'abalị foro taa, o nwere ike ịbụ ezigbo ihe. Nke a bụ makana ndị nchọpụta ekwuola na nrọ ọjọọ na-eme ka ụjọ belata n'ahụ gị mgbe ị tetara n'ụra. Lee steeti kacha nwee ọrịa HIV na Naịjirịa Mkpamkpa Iba Lasa ataala isi mmadụ anọ Ndị nchọputa a nọ na mba Swizaland na Amerịka nyochara etu ụbụrụ mmadụ si anabata nrọ dị iche iche. Ha chọpụtara na nrọ ọjọ na-akwalite etu ụbụrụ mmadụ si anabata ihe ụjọ ma onye ahụ mụrụ anya. Mana ha chọpụtara na nrọ na-eyi oke egwu a kpọrọ "nightmares" na Bekee, na-emetụta mmadụ n'ụzọ na-adịghị mma. Dọkita na-ahụ maka ụbụrụ na mahadum nke Geneva, Mahadum nke ụlọọgwụ Geneva dị na Swizaland nakwa mahadum Wisconsin dị n'Amerịka, na-ekwu na e nwereike iji nrọ gwọọ ọrịa nchekasị. Nrọ ga-akwado gị maka ihe ụjọ na-eme n'ụwa Nchọpụta a gụnyere ịma ma nrọ maọbụ oke ajọ nrọ enwere uru ọ baara mmadụ ma ncha. Mpụtara ya, nke e tinyere na ngalaba 'Human Brain Mapping' gosiri na ajọ nrọ na-enyere ndị mmadụ aka ka ha nabata ihe ụjọ na-eme na ndụ ha. Ka ajọ nrọ na-abawanye, ka ikike ibelata ụjọ na-abawanye n'akụkụ ụbụrụ na-ahazi etu mmadụ si anabata ụjọ. Nke a gosiri na nrọ ọjọọ na-akwado ndị na-arọ ya maka etu esi agbanarị ụjọ ma ha teta n'ụra. Mana nrọ ahụ jiri oke ajọ ụjọ bịa, o nwereike imebi ihe na ndụ mmadụ dịka Lampros Perogamvros onye nchọpụta na mahadum Geneva si kwuputa. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Kpọwazịkwaanụ Davido "Ichie" West Ham ejirila 'hammer' kpọọ Chelsea ntu n'isi E weghachịtala osisi si n'akwa Jesus dinara n'ime ya Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Ụra", "Naijiria", "Ahụike echiche", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50624157
Emery alaala mana ihe ji Arsenal ka jisi ha ike
Unai Emery apụọla n'otu Arsenal mana gịnị ji nkịta ọnwụ?
2019-12-01T17:08:17Z
Norwich City vs Arsenal: Emery alaala mana ihe ji Arsenal ka jisi ha ike
Pierre Emerick Aubameyang na onye otu ya O rubeghi abalị abụọ kemgbe ndị isi Arsenal chụrụ onye nkuzi ha bụ Unai Emery mana ha ka jikwa ka ha ji. Nke a pụtara ihe taa dịka ha na otu Norwich City gbara onwe ha onye laba onye laba mgbe ha zutere. Nkata ekpudola Arsenal Arachaala Arsenal ka ofe nkupu Pukki nke Norwich City pịawara goolu mbụ na nkeji 21 nke Aubameyang nke Arsenal sara ya na nkeji 29. Cantwell nyekwara goolu ọzọ na nkeji 45+2 nke pụtara na Norwich city nọ Arsenal n'ihu na ngwụcha agba nke mbụ. Arsenal asụọla Napoli akwụ n'Emirates Ekwe ndị Lyon akụọla Arsenal n'isi Aubameyang gbara penariti nke onye nche otu Norwich chetara na mbido agba nke abụọ. Ogbu opi kwukwara ka agbagharia ya bụ penarịti nke ghọrọla goolu nke abụo nyere ndị Arsenal. Arsenal nwara ike ha ị meri ya bụ asọmpị mana ọ mịtaghị mkpụrụ. Ha ga-ezute otu Brighton n'ụbọchị Tọzde ebe Norwich City ga-ezute otu Southampton.
[ "Egwuruegwu", "Bọọlụ", "Arsenal" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50624156
Manchester United so Arsenal alọ ka Ọgbọnọ
Manchester United esorola otu Arsenal na mpụtara asọmpị ha taa. Ọ bụ otu ekwe na-akụrụ ha?
2019-12-01T18:59:48Z
Man United v Aston Villa: Manchester so Arsenal alọ ka Ọgbọnọ
Anthony Martial Ọ dịka ọ bụ otu ekwe na-akụrụ otu Arsenal nakwa ogbo ha ndị Manchester egwu. Ọ bụ n'ihi etu ha si jiri ọkpụ goolu abụọ gbaa onye laba onye laba mgbe ha zutere otu Aston Villa. Ọkpụkpụ agbadola Manchester United n'olu na Bournemouth Manchester United emewela ụwa 'shut up' Agba nke mbụ agachaghịrị otu Man Utd ọfụma dịka Grealish nke Aston Villa nyere ọkpụ mbụ na nkeji 11. Man Utd nwara ịchụkwite ha mana ọ rara ha ahụ rue na ngwucha agba nke mbụ mgbe Heaton pịanyere goolu mbụ ha na nkeji 42. David de Gea bụ aka gọm na-azọ Man United ndụ Manchester United bụ igwe kachasị ebiri bọọlụ ego Lindelof gbanyere ọkpụ Man Utd abụọ na nkeji 64 mana aṅụrị ha anọteghi aka dịka Mings saghachiri ha ọkpụ ọzọ na nkeji 66. Man Utd malitere ịgba mbọ nakwa ịgbochi Aston Villa ịnye goolu ọzọ mana o nweghi ọkpụ goolu si na ya pụta. Aston Villa ka ritere otu 'point' n'agbanyeghị na ha gbara onwe ha onye laba onye laba. Dịka ụfọdụ otu egwu bọọlụ na-achụ ndị nkuzi ha, anya ndị mmadụ dị zị n'ahụ Ole Gunner Solskjaer ugbua. Akụkọ ga-amasị gị Emery alaala mana ihe ji Arsenal ka jisi ha ike Kpọwazịkwaanụ Davido "Ichie"
[ "United Kingdom", "Egwuruegwu", "Manchester United", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50626323
'Gọvanọ ọbụla ji aka ha ahọpụta ndị isioche 'Local Government' dara iwu'
Otụtụ ndị govanọ na-eji aka ha etinye ndịisioche okpuru ọchịchị kama ime ntuliaka dịka iwu Naịjirịa si dị.
2019-12-02T13:58:11Z
'Ntuliaka ka e ji ahọpụta ndị isioche LGA, ọnweghị otu ọzọ' - Onye ọkaiwu
Umuahia n'Abia Okezie Ikpeazụ, Gọvanọ Abịa steeti, ezigala aha ndị ọ họpụtara maka ịlekọta okpuruọchịchị obodo anya n'ụlọomeiwu steeti ahụ. Nke a pụtara na Abia steeti enweghị ndị isioche ọkpụrụọchịchị obodo nke ndị steeti ahụ ji ntuliaka họpụta. Akụkọ ndị dị mkpa n'ịchafụ Okezie Ikpeazu o ji ndị ọrụ gọọmentị Abia state ụgwọ akwụ akwụ? Ikpeazu achụọla ndị isioche 'local government' ọsọ Ikpeazu chụrụ ndịisioche nke mbu tupu ọ họrọ ndị nke ọhụrụ a. Odeakwụkwọ mgbasa ozi Ikpeazu bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC Igbo kwuru na Abia steeti enweghi ego ha ji ahazi ntuliaka okpuru ọchịchị. Ememanka kwuru sị: "N'ezie, ị so usoro ntuliaka họpụta ndị isioche okpụrụọchịchị dị mkpa, mana ọ bụghị ihe mbụ chere anyị n'ihu ugbua". Umuahia Agwa a abụghị naanị n'Abia steeti ka ọ tọrọ. Imo steeti n'onwe ha nwere nke ha kpọrọ "Interim Committee" bụ nke nwere onyeisioche na-elekota ha. Ọnụ na-ekwuru gọvanọ Imo kwuru na gọmenti Imo steeti ehibela kọmiti ga-ahazị ntuliaka maka ndị ọzọ ga-abanye n'ọchịchị mgbe adịghị anya. Owerri N'Anambra steeti, ha nwekwara nke ha kpọrọ "Caretaker Committee" bụ nke ha na-emegharị ọnwa atọ ọbụla. Ọnye ọchịchị ọbụla na-eme nke ọma nwere ike ịrụrụ gawa, mana a ga-ewepụ onye ọbụla na anaghị eme nke ọma. Ndị Enugwu steeti nwere ndị "Caretakers" kemgbe afọ abụọ ugbua. Enugwu Mana ha kwuburu na ha kwesiri ịme ntuliaka maka ndị isioche okpuruọchịchị na Disemba a, mana nke ahụ agataghịzị. Ndị mmadụ nwere olileanya na ha ga-eme ya bụ ntulika n'afọ ọzọ. Abakaliki Naanị Ebonyi steeti nwere ndị isioche okpuruọchịchị ahọpụtara site na ntuliaka. Ọchịchị ndị a ahọpụtara kemgbe 2017 ga-ebi na 2020 bụ mgbe ha ga-eme ntuliaka ọzọ. Mana iwu ọhụrụ e hibere na steeti ahụ kwuru na ọ bụ naani afọ abụọ ka ndị isioche okpuruọchịchị obodo ga na anọzị bido n'afọ ọzọ. Ihe iwu kwuru Malachy Ugwummadu onye ọkaiwu Onye okaiwu aha ya bụ Malachy Ugwummadụ gwara BBC Igbo na gọvanọ ọbụla na-esoghị usoro iwu kwuru eme nhọpụta na-ada iwu Naịjirịa. Ugwummadụ bụ onye sị na iwu a dị na sekshon 7 sọb seksho 1 nke akwụkwọ iwu Naịjirịa. Ọ sị na ọ bụ amaghị ihe ndị mmadụ mere ha jị gba nkịtị ka ụdị ihe ahụ na-eme. Ọ kwetakwara na gọọmenti etiti na-akwụnye ụgwọ na akpa ndị okpuruọchịchị na ahopụtaghị nke ọma na-adakwa ya bụ iwu n'otu aka ahụ. Akụkọ ga-amasị gị Uru ịrọ ajọ nrọ bara gị E weghachịtala osisi si n'akwa Jesus dinara n'ime ya Gịnị ka ị nụrụ maka Mbonu Ojike? Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Abia Steeti", "Ebonyi Steeti", "Imo steeti", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50664980
Ole ebuliela Mourinho elu mana ọgọdọ ayọchighi ya anya
Jose Mourinho lọghachiri Old Trafford n'abalị Wenezde, mana ọ gba aka wee laa.
2019-12-04T21:28:25Z
Manchester United vs Tottenham: Ole ebuliela Mourinho elu mana ọgọdọ ayọchighi ya anya
Mourinho Mourinho Ndi Igbo na-ekwu na nwata bulie nna ya elu, ọgọdọ ayọchie ya anya, Mana Ole Gunnar Solksjaer gwara Jose Mourinho n'abalị Wenezde na nke a abụghị oge niile. Ụmụ Manchester United ji ọkpụ goolu atọ a satara otu wee dulaa ndị otu Mourinho bụ Tottenham Hotspur. Manchester United so Arsenal alọ ka Ọgbọnọ Ụwa niile ahụla ọtọ Man Utd taa Ọkpụkpụ agbadola Manchester United n'olu na Bournemouth Nke a bụ nke mbụ a na-emeri Mourinho kamgbe ọ weghaara ọkwa onye nkuzi bọọlụ ndị Tottenham izu uka abụọ gara aga. Cheta na Mourinho bụbu onye nkuzi ndị Man Utd tupu a chụọ ya n'afọ gara aga were Solksjaer nọchie anya ya. Rashford nyere goolu abụọ Man Utd ji merie Rashford bụ onye nyetere goolu abụọ Man Utd ji merie n'asọmpi ahụ. N'aka nke ọzọ, Dele Ali nyeteere Tottenham otu mkpụrụ goolu ha ji gbaa aka ahịa. Mmeri a buliri Man Utd n'ọkwa ndị nke isii na tebulu 'English Premier League'. N'asọmpi ndị ọzọ, Chelse jikwa ọkpụ goolu abụọ a satara otu wee merie Aston Villa. Tammy Abraham na Mason Mount bụ ndị nyere ha mmeri a. Chelsea nọzị n'ọkwa ndị nke anọ ugbua. Jamie Vardy na James Maddison nyere goolu abụọ ndị Leicester City ji merie Watford. Ebe Liverpool na agwọ ndị Everton ịba na Anfield. Asọmpi ha ka na-aga n'ihu ugbua mana Liverpool ji ọkpụ goolu a satara abụọ emeri. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ipob Anambra clash: Gọọmenti Anambra agbala nkịtị ka ọsọ ka na-agba n'Oraifite EFCC akpụpụla Mama Boko Haram ụlọikpe Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Egwuruegwu", "Manchester United", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50664979
Gịnị na-esere ụmụ Naịjirịa na ndị Ghana ọzọ?
Ugboro ugboro ka ndị Ghana na-achụ ndị Naịjirịa na-azụ ahịa n'obodo ahụ sị ha kwara laa.
2019-12-05T04:54:12Z
Nigerians in Ghana: Gịnị na-esere ụmụ Naịjirịa na ndị Ghana ọzọ?
Ụlọahịa a gbachiri agbachi Ụlọahịa ụmụ Naịjirịa a gbachiri agbachi na Ghana n'ọgbaaghara dapụtara n'ọnwa Nọvemba Kamgbe Mọnde, abalị atọ nke ọnwa Disemba, ka ụmụ Naịjirịa na-azụ ahịa na Ghana nọ na gbagharịa ọzọ. Akụkọ kwuru na ọtụtụ n'ime ha akpọpebeghi ụlọ ahịa ha kamgbe Monde n'ihi na ụmụokorobịa Ghana ji igodo gbachie ha niile. Ndị amaghị ndị ha bụ kpochiri ọdọahịa ụmụ Najiria na Ghana Ndị Ghana a na-achụpụ ụmụ Igbo na-ere ahịa na be ha? Nwaanyị Igbo akwụọla ụdọ na Ghana Ekene Mmadugha, otu onye Naịjirịa nọ na Ghana azụ ahịa gwara BBC Igbo na ya bụ ihe na-akawanye njọ. N'okwu ya: "Izuuka abụọ gara aga ka ndị isi ahịa gwara anyị na ha nyere anyị otu izuuka ka anyị kwara laa." "Anyị kọsaara ndị uweojii maka nke a mana onweghị ihe ha mere." "Mgbe anyị pụtara n'ụbọchị Monde, anyị hụrụ na ụlọahịa anyị niile gbachiri agbachi." "Ụfọdụ gara kụwaa igodo e ji gbachie ụlọahịa ha, nke a mere ka ọgbaaghara daa." Ụfọdụ ziteere BBC Igbo ihe onyonyoo na-egosi ebe ụfọdụ ụmụ Naịjirịa na-akụpụ igodo e ji gbachie ụlọọahịa ha. Ka ọ dị ugbua amabeghi ma o nwere onye merụrụ ahụ na ya bụ ọgbaaghara. Gịnị na-ese? E nwere iwu mba Ghana nke gbochiri ndị mbịarambịara ire ahịa n'aka n'aka n'ala ha bụ nke a kpọrọ 'retail' na bekee. Aha iwu a bụ 'Ghana Investment Promotion Act' nke afọ 2013. Iwu a kwukwara na onye mbịarambịara chọrọ imepe ahịa na Ghana ga-etinye ihr ruru otu nde dọla ($1m) n'ahịa ahụ. Mana ndị obodo na-ekwu na ụmụ Naiịjrịa nọ be ha azụ ahịa ejizughi otu nde dọla azụ ahịa. Ya mere ha ji chọọ ka ha niile kwara laa. Gịnị ka gọọmentị na-ekwu? Abike Dabiri katọrọ mmechi ọdụ ahịa ụmụ Naịjirịa na Ghana Gọọmentị Naịjirịa katọrọ ya bụ mmechị ọdụ ahịa ụmụ Naịjirịa na Ghana. Abike Dabiri, bụ onye na-ahụ maka ụmụ Naịjirịa bị na mba ofesi kwuru na ya bụ ihe jọgburu onwe ya. Mana ọ rịọrọ ka onye ọbụla ghara imebi ihe maọbụ gaa ọgụ n'ihi na gọọmentị na-eleba anya n'okwu ahụ. Mịnịsta Ghana na-ahụ maka azụmahịa na mmepụta ngwaahịa bụ Alan Kyerematen N'aka nke ọzọ, gọọmentị Ghana ekwubeghị ihe ọbụla. BBC gbara mbọ ịkpọtụrụ Mịnịsta Ghana na-ahụ maka ahịa bụ Alan Kyerematen. BBC gbakwara mbọ ịkpọtụrụ onyeisi ndị uweojii na Ghana bụ David Asante-Apeatu. Mana mbọ ndị a amịtaghị mkpụrụ n'ihi na ozi e zigara n'akara 'e-mail' ha lọghachiri azụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ipob Anambra clash: Gọọmenti Anambra agbala nkịtị ka ọsọ ka na-agba n'Oraifite EFCC akpụpụla Aisha Wakil ụlọikpe 'I nwetela Tax Identification Number' gị? Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ecowas", "West Africa", "Ahịa", "Ghana" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50668553
N'ikpeazu, Sowore enwerela onwe ya n'aka ndị DSS
Omoyele Sowore na Olawale Bakare anọọla na mkpọrọ ndị DSS ihe ruru ọnwa anọ.
2019-12-05T11:53:34Z
Sowore enwerela onwe ya n'aka ndị DSS
N'ikpeazu, Sowore enwerela onwe ya n'aka ndị DSS Ọbụ na mgbede Tọzde ka Sowore na Bakare nweere onwe ha. Omoyele Sowore enwerela onwe ya. Sowore, onye nwe ụlọọrụ ntaakụkọ Sahara Reporters anọọla n'aka ndị uweojii nzuzo bụ DSS ihe karịrị ọnwa anọ. A tọhapụrụ ya na Olawale Bakare na mgbede Tọzde. Ụlọikpe enyela iwu ka atọhapụ Omoyele Sowore Ụlọikpe sị ka a tọhapụ Sowore Sowore bịa zara ọnụ ya maka ntọghapụ n'October 4 - Ụlọikpe Nke a mere dịka Ụlọikpe dị n'Abuja nyere iwu n'ehihie Tọzde ka ndị DSS were ọso were ije tọhapụ ya. Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu bụ onye nọ n'isi ikpe ahụ baara ndị DSS mba maka ijide Sowore na Bakare bụ ndị o nyere iwu ka atọhapụ. Ojukwu riri ndị SSS iwu otu narị puku Naịra (N100,000) maka nnupuisi ha. Ọbụ n'ọnwa Ọgọst a ka ndị DSS nwuchiri Sowore na Bakare n'ihi ngagharịiwe 'Revolution Now' ha na-ahazi. Igando Fire: Ọkụ ataala isi mmadụ abụọ gara ka ụkọchukwu saa ha ahụ na mmiri Ọkụ na-agba n'okpuru ogwe mmiri ahụ Ọkụ si na okporo mmanụ agbịdị agbagbuola mmadụ abụọ soro ụkọchukwu ụka ekpere gaa isa ahụ na mmiri n'Igando dị na Legọs 'ụtụtụ Tọọzde. Ndị nọ ebe ihe mere gwara BBC na otu ụkọchukwu ụka ekpere a kpọghị aha ya duru mmadụ abụọ ị ga saa ha ahụ n'iji mezuo ekpere ọ na-ekpere ha oge ya bụ ọdachị dapụtara. "Ndị nọ nso n'isi ụtụtụ ahụ gwara ụkọchukwu ahụ ka ha ghara ị ga na mmiri ahụ n'ihi na ndị ohi mmanụ kpara mkpamkpa n'abalị." "Mana ọ kwuru na nke a bụ nke atọ o kwesịrị ha eme ya iji gbochie ọdachi ịbịagide ndị bịara ịnara ekpere." "Ngwangwa otu n'ime ha kpara ọkụ, ebe nillie nwuru ọkụ." Mmadụ abụọ ndị ahụ nwụnyụụ anya, ebe ụkọchukwu zọtara ndụ ya ma nọọ n'ụlọgwụ akpọghị aha ya enweta nleta maka nnukwu ọkụ gbara ya. Akụkọ na-akọwa na ọ bụ ndị mmadụ kupuru okporo mmanụ ahụ, mere ka mmanụ na-awụba na mmiri nọ nso ebe ahụ. Ọkụ agbagbuola Fada ụka Katọlik, a tọrọ ọzọ E menyụola ọkụ na-agba n'ọdọahịa dị na Yaba Lagos, obodo na-anaghị ehi ụra Akụkọ anyị nụrụ sị na ọ bụ otu ụkọchukwu na ndị otu ya gara ekpere isi ụtụtụ na mmiri dị n'akụkụ ebe ahụ, ji uriọkụ Bekee gafee ebe ahụ mere ka ọ bara ọkụ. Ndị bi n'ogbe ahụ sị na ndị ọkụ gbatagbata abịghị n'oge imenyụ ya bụ ọkụ, bụ nke mere ha jiri were aka ha menyụwa ya bụ ọkụ. Mana ka ọ dị ugbua, ndị ụlọorụ gbatagbata Lasema ebuputala ozu ahụ ma na-achọ ma e nwere ndị ọzọ ọkụ a metụtara. Ya bụ ọkụ ka na-agba n'ime ime ya bụ mmiri ebe ukwu agaghị agali. Ndị uweojii na onwe ha erutela ebe ahụ inyere aka Ụlọomeiwu ukwu akwadola bọjet 2020 Ụlọ omeiwu ukwu akwadola akwụkwọ mkpata na mmefu nke Naịjirịa maka afọ 2020. Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari bugaara ha bọjet ahụ n'ọnwa Ọktoba. Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ gbasara budget 2020 Budget 2019: Buhari etinyela aka n'akwụkwọ Ihe Buhari depụtara gọọmentị ya ga-emefu bụ tarị Naịra iri na ụma atọ (N10.330,416,607). Mana ihe ndị omeiwu ukwu kwadoro bụ tarị naịra iri na ụma ise (N10.594,362,364). Ha kọwara na ọbụ ka ego wee zuo maka ọrụ dị mkpa gọọmentị ji n'aka, Gịnị ka nwaanyị a ji isi kote? Otu nwaanyị dị afọ iri abụọ na atọ na-azọ ndụ ya n'ụlọọgwụ ka a mụnyere ya ọkụ maka ịgba mmadụ akwụkwọ n'obodo Uttar Pradesh dị na mba India. E sunyere ya ọkụ ahụ oge ha jidere ya n'ụzọ ebe ọ na-aga n'ụlọikpe ịnụta ikpe gbasara ụmụnwoke abụọ o boro ebubo idina ya n'ike. A ga-achụ onye nchịkọta Everton? Kepu kepu si ọgbọ egwuregwu bọọlụ na-akọwa na e nwere ike ịchụpụ Marco Silva n'oche nchịkọta Everton. Ọ bụrụ na nke a mee, Silva ga-abụ onye nchịkọta nke anọ a na-achụ n'ime izu atọ a. Ndị Gọvanọ sị ka Buhari gbatara Allen Onyema ọsọ enyemaka Ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ etinyela ọnụ n'okwu gbasara ebubo mmerụaka mba Amerịka na-ebo Allen Onyema bụ onye nwe ụgbọelu Air Peace. Ha kwuru na gọọmentị Naịjirịa anaghị agba ya mgba okpuru, ma kpọkuo Onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa onye nnọchiteanya mba Amerịka na Naịjirịa ka o nyere ya aka. Aka m dị ọcha - Allen Onyema Ihe anyị ji kpọọ oku ka gọọmentị etiti mee Air Peace 'national carrier' - Anambra state Assembly Ha sị na ọnweghị ihe dị iche na ya bụ ihe mere Onyema maka na ụlọọrụ ọbụla na-eto eto na-enwe ọgbatauhie tupu o tozuo. Ndị Gọvanọ ahụ sị na ọnweghị ihe na-esere Onyema na gọmenti etiti na ha nụla ka ọ kelere ha maka inyere ya aka ịnwete asambodo ikike ruru ise maka ọrụ ya. Ha kwukwara na ọtụtụ na gọmenti Buharị akwadola Onyema n'ọrụ ya. Ndị Gọvanọ a rịọrọ onyeisiala Muhammadụ Buhari ka o biko jisike na-akwado Allen Onyema dịka o si eme. Mba Amerika boro Onyema ebubo i si azụụlọ bupu ego dị nde dollar iri abụọ ofesi maka ịgote ụgbọelu. Ụlọọrụ United State Department of Justice kpụpụrụ Onyema ụlọikpe ka ọ bịa zara ọnụ ya maka nke a. Onweghi ndị otu anyị a na-achọ achọ - Red Cross Ndị otu Red Cross ekwuola na onweghị onye otu ha ọbụla a na-achọ achọ. Nke a na-abịa dịka ndị oyindụegwu bụ Islamic State kwuru na ha atọrọla ndị otu Red Cross abụọ. Ha kwukwara na ha tọọrọ ndị ụka Kraịst asatọ na ndị agha isii na mpaghara Borno steeti dị na Naịjirịa. Atọrọkwala ndị India Akụkọ si India na-apụta na-akọwa na a tọrọla ndị mba ha ruru mmadụ iri na asatọ na otu onye si mba Tọki, nso okeosimiri na Bonny dị na Naịjirịa n'ụbọchị Wenesde. N'egwuregwu, Chelsea ekweghi anụ 'kam' ka ha ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Aston Villa na be ha na Stamford Bridge. Ebe Ole Gunnar Solskjaer na-achịkọta Manchester United ekweghi ka ọgọdọ Jose Mourinho yọchie ya anya, ka ha jikwa goolu abụọ a satara otu merie. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji: Ihe nkiri a ga-amasị gị: Akụkọ ga-amasị gị Ipob Anambra clash: Gọọmenti Anambra agbala nkịtị ka ọsọ ka na-agba n'Oraifite EFCC akpụpụla Mama Boko Haram ụlọikpe 'I nwetela Tax Identification Number' gị?
[ "Naijiria", "Abia Steeti", "Njem ụgbọelu", "Anambra Steeti", "Ebonyi Steeti", "Imo steeti", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50683865
Ụmụ Naijiria bi Spen enyela Amaechi ọsọ
Ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa bụ DSS anwụchiela Omoyele Sowore ọzọ n'ụtụtụ a.
2019-12-06T09:06:31Z
Rotimi Amaechi: Ụmụ Naijiria amaghị nke a na-akọ wakporo m na Spen
Akụkọ dị mkpa taa: Ụmụ Naijiria bi Spen enyeela Amaechi ọsọ Rotimi Amaechi Ụmụ afọ Naijiria no mba Spen kusuru mịnịsta na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi dịka ọ gara ọgbakọ mgbenwe ihu igwe nke Bekeee kpọrọ 'Climate change'na mba ahụ. Amaechi onye gbara ama ihe mere na akara Twitter ya ụbọchị Fraide kwuru na ndị uweojii ala ahụ zọrọ ya tupu ndị ahụ nwe ike imerụ ya ahụ. 'Ịwakpo ụlọikpe ịnwụchi Sowore bụ ihe ihere nye anyị na-akwado Buhari' Omoleye Sowore, onye nwe ụlọakụkọ 'Sahara Reporters' na ndị uweojii nzuzo Naijiri mere ndọndọkịrịdọ n'ụlọikpe tupu a nwụchigharịa ya Soshal Midia ewurula ọkụ dịka ihe onyonyo na-egosi etu ndị nzuzo Naijiria a kpọrọ "Department of State Security" (DSS) si nwụchigharịa Omoyele Sowore ọzọ n'ime ụlọikpe. Ndị dabatara n'ụlọikpe n'Abuja ụbọchị Fraide, ebe Sowore na-azara ọnụ ya maka ikpe gbasara ngagharịiwe 'Revolution Now' ọ haziri n'ọnwa Ọgọst, afọ 2019. Ngwangwa nke mere,ọkaikpe bilie gawara onwe ya, ọ ghọrọ egwu ndọndọkịrịdọ dịka (DSS) chọrọ iji ike kpụrụ Sowore. Nke a na-abịa na-erughị awa iri abụọ na-anọ e ji tọghapụ ya n'ụlọmkpọrọ ka ụlọikpe nyechara iwu ka a hapụ ya. N'ikpeazu, Sowore enwerela onwe ya n'aka ndị DSS Ụlọikpe enyela iwu ka atọhapụ Omoyele Sowore Sowore bịa zara ọnụ ya maka ntọghapụ n'October 4 - Ụlọikpe Ọtụtụ ndị nwere agba na Naijiria akọtọọla nnwụchi a ndị DSS nwụchirị Sowore. Obiageli Ezekwesili, onye bụbụ Mịnịsta agụmakwụkwọ kwuru na ya bụ ihe jọgburu onwe ya. Ọ dọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ ghara ikwe ka ihe ọbụla mee ya bụ nwa amadị. Ezekwesili kpọkukwara ụmụ Naịjirịa niile ka onye ọbụla bilie ọtọ ma katọọ ọchịchị aka ike Buhari Lee ihe ụmụ Naijiria na-ekwu: Otu onye ụlọomeiwu nta bụ Akin Alabi kwuru na ndị merụụ ụlọikpe, na ihe ha mere adabaghị. Otu onye ama dịka onye na-akwado onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Kayode Ogundamisi kwuru na "iwakpo ụlọikpe bụ ihe ihere nye anyị bụ ndị na-akwado ọchịchị ya." Abdullahi Buhari si na DSS kemgbe ọchịchị Onyeisiala Buhari aghọọla ihe ihere: Mana onye ọkaiwu bụ Anthony Okah gwara BBC na o nweghị ihe ọjọọ dị na ịnwụchigharị mmadụ n'ime ụlọikpe ma ọ bụụ na o nwere ebubo ọhụrụ e wetara megide ya. Sowore pụtara ọzọ n'ụlọikpe Tupu DSS atọghapụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Disemba 2019, Sowore nọrọ n'ụlọmkpọrọ ụbọchị 125. Mana ugbua a nwuchiela ya ọzọ ma maa ha ebubo ọzọ. Tupu ọgbaghara sitere na mbọ ndị DSS gbara ịnwụchị Sowore dara, Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu sị na ọ bụ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Febụwarị 2020 ka a ga-alachite maka ikpe Sowore. Onye ntaakukọ BBC sịkwa na Ọkaikpe gbara ọsọ mgbe ndị DSS wabatara ụlọikpe maka nwụchị Sowore. Gọọmenti Bayelsa si na ọ bụ nde N3.5 ka e zuru na ọbụghi nde N40 Kọmishọna na-ahu maka mgbasa ozi na Bayelsa Steeti bụ Daniel Iworiso-Markson gwara BBC na Kọmishọna ndị uweojii nke steeti ahụ enyela iwu ka a nwuchie ndị uweojii nọ nche n'ụlọ Gọomentị steeti ahụ mgbe ezuru nde Naira atọ na ọma. Ihe ị kwesiri ma maka ntuliaka Kogi na Bayelsa Steeti David Lyon nke APC emeriela PDP n'okpuru ọchịchị 6 n'ime 8 dị na Bayelsa steeti Mazi Iworiso-Markson kọwara na ndị ohi banyere n'ụlọọrụ osote onye na-ahụ maka ndị ọrụ steeti ahu were zuru ya bụ ego . Ọ gwara BBC na ndị ohi ahu gbakara igbe ego were zụrụ ego ahụ n'abalị Tuzde. Ndị ojiegbe egbuola 'DPO' na ndị uweojii atọ ọzọ na Bayelsa Obodo Brass abanyela oriri n'elu Whale Dịka o di ugbụ a, ha na eche ka ndị uweojii gwa ha ihe ha chọpụtara. Akụko ga-amasị gị 'Ịwakpo ụlọikpe ịnwụchi Sowore bụ ihe ihere nye anyị na-akwado Buhari' Mkpọrọ afọ 12 a tụrụ Kalu gosiri na ịgbaba APC abụghị ịgbanarị ikpe - Rotimi Jacobs N'ikpeazu, Sowore enwerela onwe ya n'aka ndị DSS Wizkid,Orji Uzo Kalu na Cardi-B so na ndị wuru ewu n'izu a Nna Mazi Nnamdi Kanu alaala mmụọ Nnamdi Kanu Onye eze obodo Afaraukwu, Ụmụahịa, bụ Israel Kanu, onye bụkwa nna onyeisi ndi otu Ipob bụ Mazị Nnamdi Kanu, alaala mmụọ. Nwanne Mazị Kanu bụ Emmanuel gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọbụ eziokwu na ndị ichie obodo Afaraukwu amaala ọkwa maka ọnwụ nna ya. Ihe iri ị kwesịrị ịma maka etu Nnamdi Kanu si gbanahụ ndịagha Naijirịa Nnamdị Kanu ọ ga-alọta lie nne ya? O kwukwara na ozi ọbụla gbasara ọnwụ ya bụ n'ọnụ ndị ichie Afaraukwu ka ọ ga-esi apụta. Nke a na-abịa dịka orubeghị ọnwa atọ nne ya bụ Ugoeze Nnenne Kanu nwụchara. A mabeghị ọkwa etu a ga-esi lie ha. "Knockout" agbakapụla nwatakịrị aka n'Ebonyi Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah akọwaala ka aka nwata akwụkwọ sị laa ebe ọ na-agba egbe cham eji "knockout" mara. Odah sị na ya bụ egbe cham merukwara ụmụakwụkwọ atọ ndị ọzọ nọ nso ahụ. Ihe mberede mere n'Enugu ataala isi 15 Ndị ọkụ gaasị gbagburu n'Abịa agbalitela Ụzọ Onyeama n'Enugwu bụzi aga aga O kwuru na ya bụ nwata akwụkwọ aha ya bụ Chibuike Chukwu gbara afọ iri na ise (15) nọ na SS 11 n'ụlọakwụkwọ Glory Land High School dị n'Azugwu, Ebonyi steet atụnyela akaekpe ya na ya bụ ọdachi. Odah sị na Chibuike na ndị ọzọ ometutara na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua. Ọ gosikwara nwute ka ya bụ ihe sị mee ma na-adọkwa ụmụaka aka na ntị ka ha chaara egbe cham ahụ maka ọdachị dị otu a. Odah kọwara na 'ndị ọrụ anyị ga-ejizi ndị ọkụekwe ka ha gagharịa n'ime obodo ịkọwara ndị mmadụ na iwu megidere ịgba "knockout" n'Ebonyi steeti". Ọ sị na onye obula e jidere na ha ga-ata ya ahụhụ rubere ya dịka iwu kwuru, O kwukwara na nke abụghị mbu ụdị ihe a na-eme na steeti ahụ na-arịọ nne na nna ka ha nye aka dụọ ụmụ ha ọdụ. Okwu ụmụ Naịjirịa a chụpụrụ na Kroeshia Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisioche ngalaba na-anọchite anya ndị Naịjiria bi na mba ofesi, ekwuola na o zigarala minista na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ ozi, maka ụmụaka Naịjirịa abụọ e si mba Kroeshia chụlata. Abike kwuru na n'agbanyeghi na Naịjiria enweghi ụlọọrụ nnọchiteanya na mba ahụ, na ha na-etinye anya n'ihe gbasara mmadụ abụọ a gara ịnọchiteanya mahadum FUTO n'asọmpi. Okwu Orji Uzor Kalu Otu Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) etinyela ọnụ na mkpọrọ a tụrụ Orji Uzor Kalu. SERAP sị na ya bụ ikpe kwụ ọtọ ka sịga ma sị na Kalu nwere ohere ịga ụlọikpe nke Ukwu chọọ mkpegharị. Ndị uweojii gburu mmadụ anọ n'India Ụmụnwaanyị na ụmụnwoke so mee ngagharịiwe n'obodo Hyderabad dị n'India Ndị uweojii agbagbuola ụmụnwoke anọ a na-enyo na ha gburu otu nwaanyị ka ha dinachara ya n'ike, na mba India. Ndị uweojii kwuru na ha gbara ndị ahụ egbe ka ha nwara izuru egbe ha wee gbalaga n'ụlọmkpọrọ ebe ha nwuchiri ha. Aka akparala gọvanọ Nairobi, Kenya Ọ na-amasịkarị Sonko ike ekike dịka ndị otiegwu ọgbara ọhụrụ Ndị uweojii mba Kenya anwụchiela gọvanọ Nairobi bụ Mike Sonko n'ihi ebubo nrụrụaka na ihe ndị ọzọ. O teela aka a malitere inyo Sonko enyo n'ihi nrụrụaka mana n'ụbọchị Fraịdee ka aka kpaara ya bụ ezekudele. Okwu 'nchụpụ' Trump Pelosi na ụmụ na ụmụ ụmu ndị Omeiwu Ka anyị bata ofesi ebe Nancy Pelosi bụ onyeisi n'ụlọomeiwu mba Amerika nyere Kọmitii na-ahụ maka ikpe iwu ka ha malite ịdepụta njọ Donald Trump nke ha ga-eji chụtuo ya n'ọkwa. Onyeisiala Trump bụ onyeisiala mba Amerịka nke atọ ga-enwete onwe ya n'udị ọnọdụ ahụ, sị na ya nwe mmeri. Everton chụrụ onye nchịkọta ha tinye onye ọzọ Everton achụọla onye nchịkọta ha bụ Marco Silva ọsọ mgbada, na-erughi afọ abụọ o bidochara ọrụ, maka ọnyụpa otu ha na-agba na Premier League. Duncan Ferguson gbabuuru Everton bọọlụ arigorola n'oche dịka onye ga na-achịkọta otu ahụ tupu ha akpọta onye ọzọ. Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ na-asị 'onye ga-anọchi Marco Silva'? bụ onye nchịkọta otu Everton a chụrụ n'ọrụ ụnyaahụ. Ebe ike kwụrụ ọtọ gwụ ndị na-akwado Arsenal ka Brighton ji ọkpụ abụọ a satara otu merie ha n'Emirates. Brendan Rodgers ebinyela aka n'akwụkwọ na Leicester Brendan Rodgers ga-anọgide Leicester City ruo 2025 Onye nkuzi bọọlụ ndị Leicester City bụ Brendan Rodgers ebinyela aka n'akwụkwọ ịnọgide n'otu egwuregwu ahụ. Kepukepu na-efegharịbu na Rodgers nwere ike ịga sonyere ndị otu egwu Arsenal bụ ndị chụrụ onye nkuzi ha Unai Emery izuuka abụọ gara aga. Ka ọ dị ugbua, Rodgers ga-anọ na Leicester City ruo afọ 2025. Akụkọ ga-amasị gị N'ikpeazu, Sowore e nwerela onwe ya n'aka ndị DSS Gịnị na-esere ụmụ Naịjirịa na ndị Ghana ọzọ? Ipob Anambra clash: Gọọmentị Anambra agbala nkịtị ka ọsọ ka na-agba n'Oraifite
[ "Naijiria", "Ebonyi Steeti", "National security" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50683597
Oziọma gị metutara ndụ m ebe ọ dị ukwu - Apst Johnson Suleman
Ndị mmadụ ọkachasị ndị ofufe nke Kraịst abanyela n'iri ụjụ maka ọnwụ Reinhard Bonnke.
2019-12-07T06:37:14Z
Reinhard Boonke: A na m ekpere ezinụlọ ya ekpere nkasị obi - Gov. Ifeanyi Okowa
Reinhard Boonke bụ aha ama ama na Naịjirịa maka ọru ya n'igbasa ozi nke Kraist. Ndị ofufe nke Kraist nọ n'ụju dịka ha nụrụ na Reinhard Bonnke anwụọla. Nke a na abịa dịka nwunye ya bụ Anni Bonnke kwuputara ya na 'Facebook'. Bonnke gbara afọ iri asaa na itolu tupu ọ laa mụọ. Ọ lụru nwunye ya n'afọ 1964 ma ha mụtakwara ụmụ atọ na ụmụụmụ asatọ. O bidoro mgbasa ozi nke Kraist n'afọ 1967 na Lesotho. Ọ bụ n'afọ 2017 ka Reinhard Bonnke mere mgbasa oziọma nke Kraist a na-akpọ 'Christ for All Nations' nke ikpeazu na Naijirịa. Dịka ụlo mgbasa ozi CBN siri kọwa na Bonnke nyefere ọchịchị mgbasa ozi ya n'aka Daniel Kolenda maka ahuisike. Otutu ndị ndu na ndị ofufe nke Kraist uwa niile gosipụtara iri ụjụ ha, lee ihe ụfọdụ n'ime ha kwuru N'Akụkọ ọzọ ụlọọgwụ Dews of Hope dị n'Owere Gọọmenti etiti anapụla Paschal Obi bụ bụ onye odeakwụkwọ Rochas Okorocha ụlọọgwụ ya akpọrọ "Dews of Hope Hospital". Ngalaba EFCC dere n'akara Twitter ha na ọ bụ Ọkaikpe T.G Ringin nyere iwu ịnapụ ụlọ ọgwụ a n'Owere ụnyaahụ. Ọkaikpe Ringim nyere iwu a n'Ụlọikpe Ukwu nke dị n'Owere dịka Ọkaikpe A.T Mohammed nyeburu iwu n'ụbọchị nke 22 nke ọnwa Ọgọstụ ka gọọmentị jide ya bụ ụlọ ọgwụ nwamgbenta. EFCC si na nke a bịara dịka ha na-enyobu na ego gọọmneti Imo bara na ya bụ ụlọ ọgwụ. Maazị Obi bu onye nwe ya bu ụlọ ọgwụ bụ bụ onye odeakwụkwọ Rochas Okorocha mgbe ọ bụ aka na-achị Imo steeti. Akara ntụ-ntụ Abike Dabiri-Erewa agbaruọla ihe maka mwakpo Amaechi Abike Dabiri-Erewa Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịnamma ndị Naịjirịa nọ mba ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa agbaruọla ihu maka mwakpo awakporo Minista na-ahụ maka Njem bu Chibuike Amaechi. Odoziakụ Dabiri-Erewa kelere ndị uweojii Spain maka mbo ha gbara ichekwa ndụ Maazi Amaechi ma rịọ ndị Naịjirịa bi ofesi ka ha were ezi agwa n'aga Akara ntụ-ntụ N'Ofesi, Mba Saudi Arebiya akatọọla mpka mkpa onye agha agha ha kpara na mba Amerịka ụnyaahụ Mohammed Saeed Alshamrani gbagburu mmadụ atọ ma merụọ mmadụ asaa ọzọ ahụ n'ọdọ ndị agha mmiri Amerịka dị na obodo Pensacola tupu o gbuo onwe ya Akara ntụ-ntụ N'egwuregwu Otu egwu bọọlụ Chelsea wkuola na ngalaba na-elekọta egwuregwu bọọlụ bụ Fifa emeghị ha ọfụma n'ịmachi ha igote maọbụ ree mmadụ. H asị na Fifa nyere otu Machester City ohere isi tụọ mgbere agbanyeghị na ọ iwu ha abụo dara di ka onwe ha. Akara ntụ-ntụ Rotimi Amechi Rotimi Amechi minista na ahụ maka njem Otu Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) nke Nnamdi Kanu bụ onyeisi ha ekwuola na ọ bụ ha wakporo Minista Njem bụ Chibuike Amaechi n'obodo Madrid di na Spain. Ipob sị na ọ bụ ndị otu ha nọ na Spain Kpara mkpa mkpa ma kwukwa na ọ bụ ihe ga-echere ndị nọ n'ọchịchị na Naịjirịa ebe ọbụla a hụrụ ha. 'Nnamdi Kanu na Ipob ga-arịọrịrị Ekweremadu mgbaghara' 'Ihe mere Ekweremadu bụ ịdọ ndị osu imi aka na ntị' Onye binyere aka n'akwụkwọ mgasaozi bu okwu bụ onye ama dịka Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu ahụ. Ọ sị na ọ bụ Maazị Kanu nyere ha ikike ịkpa agwa ha kpara. Cheta na Minista Amaechi dere n'akara Twitter ya na ndị ọ sị bụ ndị Naịjirịa mere ka ha wakpo ya na Spen mana ndị uweojii gbochiri ha. Ihe a mere Amaechi yiri ihe ndị Ipob mere onye bụbụ osote onyeisi Sineti bu Ike Ekweremadu na maba Jamanị. Gọọmentị Naịjirịa machiri Ipob na Naịjirịa ma kpọọ ha otu na-eyi ndụ egwu. Nnamdị Kanu n'onwe ya no n'ihu ikpe maka ebubo na o chọrọ itisa Naịjirịa tupu ọ gba ọsọ. NBA sị ka onyeisi DSS rituo n'ọkwa Otu ndị ọkaiwu akpọrọ Nigerian Bar Association na Bekee ekwuola ka onyeisi ụlọọrụ nchekwa eji DSS mara bụ Yusuf Bichi jiri ọso ọsọ rituo n'ọkwa. NBA si na nke a bụ maka mwakpo ndị ọrụ DSS mere ụylọikpe Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu maka ịnwụchị Omoyele Sowore ụnyaahụ. N'Ofesi, Ọdọ ndị agha mmiri aAmerịka dị n'obodo Pensacola Otu onye agha mba Saudi Arebiya gbagburu mmadụ atọ ma merụọ mmadụ asaa ọzọ ahụ n'ọdọ ndị agha mmiri Amerịka dị na obodo Pensacola ụnyaahụ. Nwoke ahụ mechara gbuo onwe ya mana Ron DeSantis bụ aka na-achị Florida sị na mba Saụdị Arebiya ji ndị nwe ndị eburu ụgwọ. N'egwuregwu, Joshua na Ruiz ga-ezute ọzọ n'ụbọchi 7 Desemba n'afọ 2019 Ọ ga-akpọtụ akpọtụ taa na mba Saụdị Arebiya mgbe Andy Ruiz na Anthony Joshua ga-ezute ma suo ọkpọ n'elekere iri na otu nke abali. Asọmpị a bụ mpiaghari nke ha piara n'ọnwa Juun 2019 oge Ruiz kpịaturu Joshua n'agba nke asaa. Egwu Bọọlụ Obi bụ ndị Everton pọlịnapọlina dịka ha merrir ndi Chelsea were gbagote na gba nke 14 Everton ejirila ọkpụ goolu asatara nanị otu were piawa ndị otu egwu bọolụ Chelsea azu. Nke a na-eme na agbanyeghi na ndi Everton nyere onye nkụzi ha bụ Marco Silva ọso n'ụbọchị Fride.
[ "Naijiria", "Nnamdi Kanu", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50683596
Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka oche Kalu dịka a tụrụ ya mkpọrọ afọ 12
Ọ gịnị ga-emezi oche Orji Uzor Kalu n'Ụlọ Omeiwu Ukwu dịka a tụrụ ya mkpọrọ afọ iri na abụọ.
2019-12-07T15:04:54Z
Orji Kalu: Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka oche onye omeiwu ikpe mara
Ọrji Uzor Kalu Okwu na-atụrụ aka chiburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu mkpọrọ afọ 12 maka nrụrụaka abụghị ihe a ka na-akọrọ onye ma ihe na-eme na Naịjirịa. Mana, okwu ihe ga-eme oche ya ka bụkwa ụkwa akpụ n'ọnụ. Mkpọrọ afọ 12 a tụrụ Kalu gosiri na ịgbaba APC abụghị ịgbanarị ikpe - Rotimi Jacobs Ụlọikpe mkpegharị enyela Orji Uzor Kalu mmeri Maazị Kalu napụru Mao Ohuabunwa oche dịka onye na-anọchịta anya Abia Nọt n'Ụlọ Omeiwu Ukwu na ntụlịaka nke 2019. Maazị Ohuabunwa gbajọrọ mkpebi Inec were ga kpesara ụlọikpe ntulịaka. Ohuabunwa chọbụru ka akagbuo ntuliaka emere na Bende na Isikwuato mana n'ubọchị 11 nke ọnwa Nọvemba Ụlọikpe mkpesa kwadoro mmeri Kalu. Maka onye a mara ikpe, iwu Naịjirịa sị na onye ahu agaghị azọnwụ ọchịchi ruo afọ iri. Kedu ebe Kalu nọ n'iwu a? Orji Kalu nwetere ọkwa "Chief Whip" n'Ụlọ Omeiwu nke itoolu Ọkaiwu Chijioke Ikeh gwara BBC Igbo na okwu ihe ga-eme oche Orji Uzor Kalu na Ụlọ Omeiwu Ukwu kwụ ọtọ dịka ihe iwu Naịjirịa kwuru bụ na onye ọbụla a mara ikpe n'ụloikpe maka nrụrụaka na mpụ ndị ọzọ agaghị azọ ọchịchị maọbụ kwụrụ ka ndị mmadụ tunyere ha vootu ruo afọ iri. N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Ikeh sị na ugbua ikpe mara Maazị Kalu onwekwarụ ebe iwu Naijirịa dewere ya. Ọ sị; "Ihe iwu Naịjirịa kwuru bụ na Kalu ka bụkwa omeiwu makana ikpe mara ya oge emechara ntụlịaka ma hopụtaya dịka omeiwu. "Ihe iwu kwuru bụ na etu ọ nọ mkpọrọ, ọgaghị abịanwụ bịa nọchite anya ndị ọ na-anọchite anya ha ruo ihe gafere ọkara oge a na-ezukọ n'ime afọ, onyeisi Sineti nwere ike kwuo na mmadụ anaghị anọchite anya mpaghara ya." Ọ gara n'ihu si na ihe a ga abụzị na-enwereike mee ntụliaka ọzọ ji nwete onye ọzo ga-anọchite anya mpaghara o si. Afọ ole ka Kalu nwereike ịno na mkpọrọ? Ka ọ kwụ ugbua, a na-ele anya na Kalu nwereike chọ mkpegharị dịka ọ ka nwere ohere ya, mana ya bụrụ na ọ chịtaghị aja na ya bu mkpegharị, onwereike nọdu ruo afo 12 na mkpọrọ. Nke a mee, ihe Ọkaiwu Ike kwuru nwereike mee, nke ga-apụta na a ga-azọgharị oche Abia Nọt a n'azụ Kalu. BBC Igbo gbara mbọ inụta n'ọnụ Mao Ohuabunwa ịmata ma o nwere okwu maka atụmatu ahụ adabaghi.
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Mpụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50690191
Manchester United abụrụla Eze obodo Manchester
Mbe abụọ zutere na Manchester taa mana uwa niile amarala nke bụ oke.
2019-12-07T20:09:43Z
Manchester City vs Manchester United: Man Utd bụ Eze ama n'obodo Manchester
Ndi otu egwu boolu Man Utd Manchester United egosila Manchester City na ọ bụ ha bụ Eze Ndị Manchester United egosila na agadị nwaanyị anaghị aka nka na-egwu ọ ma agba dịka ha ji okpu goolu abụo astara otu were merie ndị Manchester City. Nke a bụ mmeri nke mbu ndị otu Manchester United na-enweta na abụghị na 'Old Traford'. Liverpool apịwaala Man City ọnụ ka ụdara ụgụrụ Ọkpụkpụ agbadola Manchester United n'olu na Bournemouth Na nkeji nke abụo n'agba nke mbu ka Raheem Sterling mere ka ọ chọro iyija ndị Man Utd mana enweghị ebe ọ gara. Fred na ndị otu ya etipịala ManCity Nkeji nke iri abụọ na atọ ka Man Utd nwetara penariti mgbe Bernardo Silva gbaturu Marecus Rashfor na-etiti ọnụ goolu ndị Manchester City. Manchester United so Arsenal alọ ka Ọgbọnọ David de Gea bụ aka gọm na-azọ Man United ndụ Rashford gbara ya were ziga Ederson Aba ebe bọọlụ gawara Abakaliki. Nke a kpaliri mụọ ndị Man Utd dịka ha bidoro chawa ndị Man City ọkụ. Man Utd ahụla Liverpool teta n'ụra ọnwụ Ekwensu anya mmeemmee ndị Man Utd abịala ha ụgwọ? Anthony Martial mezuru ya goollu abụọ mgbe ọ were shọtụ gbakaa netị ndị ManCity na nkeji nke iri abụọ na itolu. Raheem Sterling gbalịri ike ya mana...ndo Manchester City enweteghị onwe ha tupu agbacha agba nke mbu. Norwich emeela Man City ka ewu akpụkpa ntị Man. City afọnyela West ham n'akpa Ka agba nke abụọ bidoro, ndị otu a mara onwe ha aka. Kama Nicolás Otamendi ji isi were mepee neti ndị MandUtd na nkeji iri asato na ise. Sheffield abụrụla anụ kpọrọ nkụ juru Man Utd ọnụ 'Wheel' Ole ji buru ndị Man Utd ọdapụla daba n'ime ọhịa? ManchesterCity nwara ike ha ma dịka o siri dị nanị otu ndị ga-abu eze na obodo Manchester - Manchester United. Akụkọ ga-amasị gị Everton ewerela ajị imi Chelsea kpọrọ ụtaba Nnewi, Awka na obodo ndi ọzọ nwere anụmanụ ha na-akwanyere ugwu Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka oche Kalu dịka a tụrụ ya mkpọrọ afọ 12 Oziọma gị metutara ndụ m ebe ọ dị ukwu - Apst Johnson Suleman
[ "Manchester City", "Manchester United", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50703736
Ọbụghị Buhari ziri DSS gaa nwụchie Sowore ọzọ - Ụlọọrụ Onyeisiala
Garba Shehu, ọnụ na-ekwuru onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ndị DSS na-arụ ọrụ dịịrị ha nke bụ ichekwa Naịjirịa.
2019-12-08T08:00:47Z
Omoyele Sowore: Ọbụghị Buhari ziri DSS gaa nwụchie Sowore ọzọ - Ụlọọrụ Onyeisiala
Ndí a na-eche na ha bú ndí DSS nwụchiri Sowore n'ime ụlọikpe n'Abuja n'ụbọchị Fraịde Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ọbụghị Buhari ziri ndị ngalaba Department of State Services (DSS) ka ha nwụchie Omoyele Sowore ọzọ. Garba Shehu ọnụ na-ekwuru Buhari kọwara nd ndị DSS na-arụ ọrụ dịịrị ha nke bụ ichekwa Naịjirịa. Ụlọikpe sị ka a tọhapụ Sowore Ụlọikpe enyela iwu ka atọhapụ Omoyele Sowore N'ikpeazu, Sowore enwerela onwe ya n'aka ndị DSS Ụmụ Naijiria bi Spen enyeela Amaechi ọsọ Shehu kọwara na ndị DSS agaghị agba nkịtị, fanye aka n'ụkwụ ka ndị mmadụ laa obodo Naịjirịa n'iyi. Dịka Shehu si kwuo, "Sowore gara ji ihe onyonyoo TV nakwa ụlọọrụ ntaakụkọ ya bụ Sahara Reporters wee gbasaa ozi iji weta ọgbaaghara n'obodo ma chụtuo onye nọ n'isi ọchịchị." "Onweghị gọọmentị ọbụla ga-agba nkịtị ka mmadụ ọbụla bute ọgbaaghara na mmebi ihe n'obodo." Garba Shehu Shehu kwuru na ọbụ etu ahụ ka ndị otu oyiegwu Boko Haram si malite, mana ọchịchị Buhari agaghị ekwe ka ọzọ mee. Cheta na ọnụ na-ekwuchitere ndị DSS bụ Peter Afunanya kọwaburu na ọ bụghị ndị otu ha bara n'ime ụlọikpe jichie Sowore. Afunanya kwuru na ha ọ bụ na ezi ụlọikpe ahụ ka ha nọrọ nwude Sowore. O kwuru na ihe niile ndị mmadụ hụrụ n'ihe onyonyoo nke na-efegharị na soshal midia bụcha asị asị. Ọkụ agbagbuola mmadụ 40 na India Mmadụ iri anọ anwụọla n'ọkụ gbara otu ụlọọrụ nrụpụta ihe dị n'obodo Delhi nke mba India. Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ọkụ ahụ malịtere ịgba n'etiti abalị gburu ọtụtụ mmadụ nọ n'ime ebe ahụ ehi ụra. Ụlọ na-agba ọkụ n'ahia Balogun, Legọs Akụkọ ndị ọkụ gbara ahia ha n'Onicha A ka na-eme nyocha ịchọpta ihe butere ya bụ ọkụ ebe ndị ọrụ gbata gbata ka chị obi n'aka na ụfọdụ mmadụ ka ga-anwụ. N'akụkọ ọzo, Ndị ọrụ gbata gbata RedCross na enyere ndị mmadụ aka Oke ide mmiri eriela isi mmadụ iri na isii na Uganda. O bụ oke mmiri ozizo nke biara kaawa njọ site n'ụbọchi Fride rụo satụde butere mkpamkpa a. Otụtu ndi mmadu nke karịri otu narị anwụola na ọwụwa anyanwụ nke Afrịka maka mkpamkpa ide mmiri. Ọ bụ asị! IPOB etighị m ihe - Amaechi Rotimi Amechi minista na ahụ maka njem Ndị otu Minista na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi ekwuola hoo haa na o nweghi mgbe ndị otu "Indigenous People of Biafra" IPOB ji tie onyeisi ha ihe. Ha kwenyere na o doro anya na akwadoro ịwakpo ya bụ Amaechi mana ọ zọrọ isi onwe ya rue mgbe ndị uweojii mba spen ji zọpụta ya. 'Aka m adịghị na ọgbaaghara dara na Rivers' Mugabe hapụrụ $10m wee nwụọ na-ekeghị ekpe Ọ bụ ụlọọrụ mgbaza ozi Rotimi Amaechi wepụtara ya bụ ozi, Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na okwu na-efegharị nke atụrụ aka na ọ bụ Emma Powerful(ọnụ na-ekwuru Ipob) depụtara bụ okpotokpo asị. Cheta na akụkọ nakwa ihe onyonyo pụtara na ngwụcha izu ụka a gosiri ebe ndị otu Ipob na-aba mba na ha ga-eti Rotimi Amaechi ihe. Ruiz ị dị aghaa taa? Gee akụkọ ụwa n'ime otu nkeji ebe a Ihe nkiri Akụkọ ndị ga-masị gị Ekele dị iche iche e ji mara ndị Igbo Everton ewerela ajị imi Chelsea kpọrọ ụtaba Nnewi, Awka na obodo ndi ọzọ nwere anụmanụ ha na-akwanyere ugwu
[ "Naijiria", "Njem", "Njem", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50712066
Ipob a ga-arịọ Rotimi Amaechi mgbaghara ugbua?
Ụfọdụ ndị ntorobịa si mpaghara Niger-Delta chọrọ ka ndị otu Ipob rịọ Amaechi mgbaghara maka ihe e tiri ya na Madrid.
2019-12-09T12:40:53Z
Ipob a ga-arịọ Rotimi Amaechi mgbaghara ugbua?
Amaechi Ndị otu kpọrọ onwe ha Concerned Youths of Niger-Delta (CYND) chọrọ ka ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) rịọ Rotimi Amaechi mgbaghara. Nke a si n'okwu Ipob ziputara, ebe ha sị na ọ bụ ha wakporo ma tie Amaechi bụ mịnịsta na-ahụ maka njem na Naịjiria ihe n'obodo Madrid dị na mba Spen. Ụmụ Naijiria bi Spen enyela Amaechi ọsọ Ihe iri ị maghị maka Mahadum Njem a na-arụ na Daura O nweghi ihe na-esere Oshiomhole na Amaechi - APC Cheta na ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful kwenyere na ha bụ ndị Ipob chọrọ iwakpo Amaechi na mba Spen ka ọ gara ọgbakọ maka mgbanwe ihu eluigwe. Amaechi gbara ama ihe mwakpo a n'akara Twitter ya: Amaechi gakwara n'ihu, site n'akwụkwọ mgbasaozi o zipụrụ, kwuo na ndị Ipob akpaghị ya aka, n'agbanyeghị ihe Ipob na-ekwu. Ihe onyonyo ndị Ipob tinyere na soshal midia gosikwara ka ụfọdụ n'ime ha na-ekwu na ha "enweteghị" Amaechi. Nke a na-egosi na eziokwu nwereike ịdị n'ihe Minista Njem na-ekwu. BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful ka o tinye ọnụ n'okwu a otu a si na ha na-ekwuru ndị Naịja Delta kwuru, mana ekwentị ya agaghị. BBC Igbo kpọkwara ndị na-ekwuru Maazị Amaechi mana ha sị na okwu a otu a kwuru abụghị ihe ha ga-etinyenwu ọnụ makana ha amaghị ebe ya bụ otu si pụta. Mwakpo ndị nọ n'ọchịchị bụ atụmatụ ọhụru Ipob wepụtara site n'oge ha wakporo onye bụbu osote onyeisi Ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu na mba Jamini. Nyocha BBC Igbo mere maka otu CYND a gosiri na ọ bụ ka ha wepụtara okwu a ka ebu ụzọ nụ maka ha. Akụkọ ga-amasị gị: Lee nwaanyị kachasị mma n'ihu eluigwe Imo State bụ ebe aka azụ kacha dị nta na Naịjirịa - NBS Lee ka esi mee mmemme Olu na Delta steeti Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Njem", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50712067
Ị ma ntorobia bụ 'ewu akpụkpa ntị'? Lee etu ị ga-esi kwa nku ya
Dịka ụfọdụ ndị ntorobịa na-eme isi ike ma ha na-eto, akụkọ a ga-agwa gị ihe ị ga-emenwu maka ya.
2019-12-09T14:53:37Z
Youth Empowerment: Ị ma ntorobịa bụ 'ewu akpụkpa ntị'? Lee etu ị ga-esi kwa nku ya
Nwata na-agba egwu Ị ma ntorobia na-eme isi ike maọbụ nke a na-anaghị ata ntị ya ata? Anyị chọrọ ịgwa gị etu ị ga-esi kwa nku ya. Dịka ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-enupu isi, na-eti ndị nkuzi ha ihe, nakwa ndị nke na-eti ibe ha ihe, akparamagwa ndị a so na ndị na-enye ndị nne na nna na ndị ọzọ nchekasị gbasara ọzụzụ ha. Uche ndị ntorobịa gbasara ọnụ isi Uche ndị ntorobia gbasara soshal midia Uche ndị ntorobia gbasara ime enyi tupu a banye alụmdi na nwunye Ndị Afrịka kwenyere na otu onye anaghị enwe nwa, nke bụ na nwatakịrị gbaa isi akwara na ọ gaghị akpazi agwa ọfụma, ụfọdụ ndị ga-achọ itinye aka hụ na ọ pụtara mmadụ. Ụfọdụ ihe ndị ntorobịa na-enye nsogbu na-eme: Ịṅụ ọgwụ ike Ọgụ na mgba Esemokwu Ịṅụ oke mmanya Ịchụ oke nwaanyị Ịkparị mmadụ Nkonukọ ndị enyi na-adịghị mma BBC Igbo kpọrọ ndị ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta ọha ebe ọ metụtara ndị ntorobịa, ndị gwara BBC Igbo etu ị ga-esi ejikwa ntorobịa. Etu ị ga-esi jikwa ntorobịa na-enye nsogbu: Bụrụ enyi ya: Ihe ọma ị ga-emenwuru ntorobịa na-eme isi ike bụ igosi ya na ị bịaghị ịta ya ụta, na ọ bụ enyi ya ka ị chọrọ ịbụ. Gosikwa ya site n'inye ya ntuziaka si n'ihe ị mụtara ka ị na-eto, ahụmihe ị hụrụla n'ụwa nakwa ihe ndị ị mụtarala n'ahụmihe ndị ọzọ ọkachasị gbasara ọnọdụ ọ nọ mgbe ahụ. Na-akpanyere ha nkata, kpọrọ ha pụọ apụ, ebe ị ga-esonwu ya mee ihe ga-enye ya ọṅụ, ka o nwee ike inye gị ohere ịmata ihe na-aga n'uche ya. Ime nke a ga-egosi ya na ọ bụghị nkarị ka ị chọrọ igosi ya, kama na ọ bụ ihe ọma ka ị chọrọ imere ya. Ọ ga-emekwa ka onye ahụ nwee ike ịbịakwute gị ma o nwee nsogbu. Nye ya ohere ikwu uche ya: Ntorobia meta ihe e ji abara ya mba dịka ịlụ ọgụ maọbụ imebi ihe, buru ụzọ gee ya ntị mara ihe mere o ji mee ihe o mere; kama ibido bawa mba maọbụ iti ya ihe. Ịjụ ya ụdịrị ajụjụ nchọpụta a ga-eme ka i nwee ike ịmata ihe mere o ji kpaa ụdịrị agwa ahụ ọ kpara mgbe ahụ, ma mara etu ị ga-esi gbochie ya ka ọ ghara ime ọzọ. Bụrụ onye a ga-eṅomi: Kama ịbụ 'onye oke ekwurekwu', bụrụ onye 'oke omume'. Nke a bụ makana ụmụaka na ntorobịa na-aka amụta ihe site na ṅṅomi karịa site n'ihe ị gwara ha mee. Ị ga-agba mbọ hụ na ị na-eme ihe ọma n'akụkụ ha, ka ha nwee ike si n'ahụmihe gị mụrụ akọ. Tụkwasị ya obi: Ịtụkwasị mmadụ obi dị ka inye ya ọrụ nke a na-akpọ 'Responsibility' na Bekee. Ọ mara na ị nwere ntụkwasị obi n'ụdịrị mmadụ ọ bụ, ọ ga-agba ezigbo mbọ hụ na wụghị gị n'ala. Ọ gaghị achọ ka o meta ihe ga-emenye gị ihere maọbụ mee ka ị hụ ya ka onye abaghị uru. Akụkọ ga-amasị gị: Imo State bụ ebe aka azụ kacha dị nta na Naịjirịa - NBS Lee ka esi mee mmemme Olu na Delta steeti Lee nwaanyị kachasị mma n'ihu eluigwe Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50710749
'Onyeisiala Buhari achụghị Tunde Fowler n'ọrụ, ọ bụ oge ya gwụrụ'
Oge onye bụbu onyeisioche bụ Babatunde Fowler bịara na njedebe n’ụbọchị Monde nke Nami ji nọchie anya ya.
2019-12-09T16:59:40Z
Muhammad Nami: 'Onyeisiala Buhari achụghị Tunde Fowler n'ọrụ'
Muhammad M. Nami na Muhammad Buhari Onyeisiala Muhammadụ Buhari akpọọla aha Muhammad Nami dịka onye ga-abụrụzi onyeisioche Federal Inland Revenue Service ọhụrụ. Muhammad Nami ga-anọchi anya Babatunde Fowler nke oge ya bịara na njedebe n'ụbọchị Monde. Cheta na Onyeisiala Buhari gọrọ isi onwe ya na ọ naghị enyocha Fowler maka mpụ n'ọnwa Ọgọst afọ a. Nami ga-anọ n'ọkwa ya rue mgbe ndị ụlọomeiwu mere mkepbi maka onye ga-anọchị ọkwa ahụ kpam kpam. ISWAP egbuola ndị agha Naịjirịa abụọ nakwa otu onye uweojii Ihe onyonyo na-efegharị egosila etu ndị na-eyi ndụ egwu na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka bụ ISWAP si gbuo ndị agha Naịjirịa abụọ nakwa otu onye uweojii. N'ime ihe onyonyo ahụ nke Channels TV nwetara, kọwara etu ụfodụ ndị bu egbe n'ime ya si bụrụ ndị otu ISWAP. Boko Haram awakpoola Maiduguri ọzọ Etu Boko Haram si gbuo onye ọrụ enyemaka Akụkọ kwuru na ndị ahụ e gburu bụ ndị e si na mgbochi ụzọ adigboroja tọrọ n'obodo Benisheik dị na Maiduguri. Ndị ahụ kwuputakwara aha ha nakwa ọkwa ha n'ụlọọrụ nchekwa ha si tupu agbagbuo ha. EFCC akpụpụla Mama Boko Haram ụlọikpe Ụlọọrụ ntaakụkọ Channels kwukwara na onyeisi Lafiya Dole bụ Ado Isa gwara ha na ọ maghị maka ya bụ ihe onyonyo O kwukwara na ọ nụbeghị maka ndị e gburu ma kwee nkwa na ọ ga-eme nchọpụta gwakwa ha n'oge adịghị anya. Anti Doping Agency: A machiela Rọshia isonye n'asọmpi egwuregwu ọbụla Rọshịa agaghị esonye n'asọmpi ọbụla ruo afọ anọ Otu na-ebu agha megide ịṅụ ọgwụ ike a kpọrọ Anti-Doping Agency (Wada) amachiela mba Rọshia isonye n'ụdọ egwuregwu ọbụla site ugbua ruo afọ anọ. Ndịisi otu a mere mkpebi a n'ọgbakọ ha mere na Lausanne dị na Switzerland maka ndị na-ebu agha megide ịṅụ ọgwụ ike na Roshia achọghị inyeaka maka inyocha ndị otu ha ṅụrụ ọgwụ ike. World Cup 2018: Rọshịa emeriela Ijipt 3-1 World Cup 2018: Ndị n'ọchị ndị n'akwa Nke a pụtara na a gaghị agụ abụ njirimara Rọshia maọbụ fee ọkọlọtọ ha n'asọmpi Tokyo Olympics 2020 nakwa asọmpi Iko Mbaụwa 2022 na Qatar. Mana ndị egwuregwu e nyochara ma chọpụta na ha dị ọcha ga-esonye n'asọmpi dịka ndị kwụrụ onwe ha. Nwata nwoke kpọrọ enyi ya nwaanyị ọkụ Alabi Tolani Mariam bụ nwata nwaanyị dị naanị afọ iri abụọ na anọ, anwụọla ka enyi ya nwoke mụnyere ya ọkụ na Legọs. Enyi ya nwoke bụ Ifeanyichukwu Victor dị afọ iri na itoolu, gwara ndị uweojii na ọ kpọrọ ya ọkụ mgbe ọ chọpụtara mmekọrịta ya na nwoke ọzọ. Amachiela ahịa mbugharị n'Arịarịa Okezie Ikpeazu weere oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Gọvanọ Okezie Ikpeazụ nke Abia Steeti amachiela ahịa mbugharị n'akụkụ ahịa Arịarịa dị n'Aba iji belata unyi na ihe ndị ọzọ. Ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị steeti ahụ bụ Onyebuchi Ememanka, sị na gọvanọ nyere iwu ka ndị a baa n'ime ahịa gaa chọrọ ụlọahịa karịa ibugharị ahịa. N'ofesi Ọ dịzịkwa ka ụmụnwaanyị anaghịzi achị n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị ugbua dịka nwaada Sanna Marin dị afọ iri atọ na asatọ ga-abụ praịm mịnịsta kachasị pee mpe n'afọ na mba Finland. Ọ ga-abụ onye ndu pati ise ekpokọtara ọnụ nke ndịisi ha bụcha ụmụnwaanyị. N'egwuregwu Kelechi Iheanacho na ụmụnne ya na Premier League achịtaghị aja ọfụma Ajụjụ dị ndị mmadụ n'ọnụ ugbua bụ ma Leicester City ọ ga-achụkwutenwu Liverpool n'ogogo tebulu Premier League? Nke a bụ makana Liverpool bụ ndị mbụ, ji akara ise karịa ndị Leicester bụ ndị abụọ n'agbanyeghi na ụzọ ka dị anya. Etu ndị Naịjirịa siri nwaa n'asọmpi Premier League Nkeji Lee nwaanyị kachasị mma n'ihu eluigwe Nwafọ mba Saụt Afrịka bụ Zozibini Tunzi eturula ugo dịka nwada kachasị mma n'ihu eluigwe na ụwa a kpọrọ 'Miss Universe' nke afọ 2019. O mere nke a mgbe o gosiri ndị ọkaikpe na ihe ọ na-eme doro ya naya nke ọma site n'ịga ije nganga nakwa ịza ajụjụ ndị na-eso ya. Ihe Imo state ji bụrụ "elelebe ejeghi ọrụ" Mgbe a jụrụ ajụjụ maka ụmụaka ụmụnwaanyị, Tunzi sị na ihe kachasị mkpa ha kwesịrị ị mụta bụ etu e si abụ onye ndu. Ndị na-eso ya n'azụ bụ Madison Anderson si mba Puerto Rico na Sofia Aragon nke mba Mexico. Nwada a nwetere mmeri a n'emume nke ugboro iri isii na asatọ e mere ụnyaahụ n'Atlanta Georgia dị na mba Amerịka. DSS nyụrụ nsị n'ụlọụka Ọkaiwu Omoyele Sowore bụ Femi Falana sị na ndị nchekwa DSS ma na ha nyụrụ nsị n'ụlọụka maka nwakpo a sị ha wakporo Sowore n'ụlọikpe nke mere ha ji rịọ ọkaikpe Ijeoma Ojukwu arịrịọ. Nke a dị n'ozi o wepụtara na Sọnde iji katọọ okwu ndị DSS kwuru na ọ bụghị ha wakporo ụlọikpe n'ụbọchị Fraịde. N'ikpeazu, Sowore enwerela onwe ya n'aka ndị DSS Ọ sị na ozi a DSS wepụtara bụ ịtụgide onwe ha asị n'isi nakwa ị gọnarị agwa ọjọọ ndị ọrụ kpara n'ụlọikpe ukwu dị nAbuja. Mana ọnụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afunnaya sị na onweghi mgbe ha wakporo ụlọikpe, na ọ bụ n'ezi ka nwụchiri Sowore. Cardi B etinye esemokwu n'etiti Naịjirịa na Ghana Ndị Gana na ndị Naịjirịa na-adọri onwe ha na soshal midia maka njem nwada mba Amerịka na-eti egwu bụ Cardi B mere na mba ndị a. Ndị Gana na-ewe iwe na Cardi B emeghi ha nke ọma dịka o si mee ndị Naịjirịa maka na ọ pụtaghị ka ya ndị a ma ama ha nwee mkparịtaụka. Ha sị na ọtụtụ ndị na-eti egwu a ma ama na Ghana pụtara n'igwe na-eche Cardi B mana ọ pụtaghị. Mana Cardi B sị na afọ na-asa ya n'ihi nri o riri na ọ bụ ya mere ọ pụtaghị ka ya na kparịtaụka. N'ofesi Ndị uweojii sị na ha na-achọ ọtụtụ mmadụ achọ na mba New Zealand ebe mgbawa ugwu a kpọrọ Volcanic eruption mere. Akụkọ kwuru na a hụrụ ndị njem nlegharịanya ka na-aba n'ogige ugwu ahụ tupu mgbawa ugwu a emee. Nkeji Ihe nkiri
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Ịṅụ ọgwụ", "Rọshia", "Naijiria", "Ịṅọgwụ ike", "South Africa", "Ghana", "Abụ", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50720635
Etu onye na-arụrụ ha ọrụ si gbuo nwụnye onyeisi Maersk na Lagos
Onye na-arụrụ Gildas Tohouo ọrụ ọkụ Latrik wakporo ya ma gbuo nwụnye ya na be ha na Lagos.
2019-12-09T19:08:02Z
Maersk MD: Etu onye na-arụrụ ha ọrụ si gbuo nwụnye onyeisi Maersk na Lagos
Ụlọ ọrụ Maersk so n'ụlọ ọrụ kachasị buo ibu n'ihe banyere njem ngwaahịa n'elu mmiri Ụlọ ọrụ Maersk so n'ụlọ ọrụ kachasị buo ibu n'ihe banyere njem ngwaahịa n'elu mmiri Onyeisi ụlọọrụ Maersk nọ n'ụlọ ọgwọ alụ ọgụ ọnwụ na ndụ dịka onye na-arụrụ ha ọrụ latrik wakporo ya ma gbuo nwunye ya n'abalị Sọnde. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Elkana Bala gwara BBC Igbo na Olamide Goke bụ onye na-arụ ọkụ latrịk kpọrọ enyi ya nwoke bụ Ade Akanbi ka ha ga ohi n'ụlọ Gildas Tohouo. Nwaagbọghọbịa ọzọ anwụọla n'ụlọ oriri na nkwari na Delta Ị bụ onye mwakpo ụmụwaanyị - Ụlọịkpe Bala sị na mmadụ abụọ nwetere ohere ịbanye be Maazị Tohouo, bụ onye Kamerun, makana Goke na-arụrụ ya ọrụ ma bụkwara onye ama ama n'ụlọ ahụ. Dịka uweojii siri kwuo, mmadụ abuo gara n'ihu wakpo Tohouo, jiri mma makasị ya na nwụnye ya bụ Bernadette Tohouo ahụ. Ka ihe a na-eme, dịka ndị uweojii siri kwuo, he nwetere ozi ma wụchie ebe ahụ. Bala sị: "Ndi uweojii nọ n'Ikoyi ruru ma nwụchie ndị kpara mkpa mkpa a n'ebe ahụ." Akpọrọ di na nwụnye a awakporo gawa ụlọ ọgwụ mana odoziakụ Tohouo anwụọla. "Maazị Tohouo n'onwe ya ka dị ndụ ma na-anata ọgwụgwọ." Maazị Bala si na Goko na Akande kwetere na ọ bụ ha kpara ya bụ arụ. Ọ sị na ha sara ajụjụ ihe mere ha jiri kpaa ike a etu: "Ọ bụ ohi ka anyị gara." Bala si na ya nwetere "ATM" na akpa ego dị ha zutere n'aka ha." Ọ sịkwa na Goke sị na on were oge ya sị ka Maazị Tohouo binye ya ego ọ jụ, nke so bụrụ iwe ya o jiri gawa ohi na be ya.
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50725084
Buhari ahọrọla Adamu dịka onyeisi Amcon
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ahọpụtala Edward Adamu dịkaz onyeisi ụlọọrụ Amcon.
2019-12-10T08:30:44Z
Amcon: Buhari emeela Adamu onyeisi
Edward Adamu Buhari ahọrọla Edward Adamu n'ọrụ dịka onyeisi otu na-ahazi akụnaụba gọọmentị nke a a kpọrọ Amcon( Asset Management Corporation of Nigeria) n'aha ịchafụ. Nhọpụta dị n'ozi nke onyeisiala Buhari zigara ndị ụlọomeiwu ukwu ụbọchị Tuzde. Adamu ga-anọchị Muiz Banire , onye e mere onyeisi Amcon n'afọ 2018. Ndị ọzọ Buhari họrọ ọrụ gụnyere Godwin Emefiele, ụlọakụ etiti Naijiria(Central Bank of Nigeria), Ladidi Bara'atu Mohammed dịka onye isi ụlọọrụ ọkaiwu ukwu Naijiria, (Office of the Attorney-General of the ederation), nakwa Fatima Z. Hayatu dịka onyeisi mịnịstrị na-ahụ maka ego. Akụkọ ka na-abịa... Onyeisiala Buhari agaala Ijipt Nke dịka ibe ya bụ na onyeisiala Buhari ahapụla Naijiria n'ehihe taa bụ Tuzde gawa Eypt maka ọgbakọ udo na ọganihu Afrịka. Orji Kalu ga-anata ụgwọ ọnwa ya n'uju N'agbanyeghị na atụọla ya nga mkpụrụ ọka, Orji Uzor Kalu ga-anata ụgwọ niile ruru ya dịka onye omeiwu n'uju. Ala Naịjirịa a ga-ama jijiji? N'egwuregwu, Anthony Joshua onye kụrụ Andy Ruiz Jnr isi aba oku na Satọde iji nata ọkwa ọkaibe mbaụwa na ịkpụ ọkpọ ekwuola na ọ ga amasị ya inwe asompi ịzọ ọkwa ya n'ala Naijiria. Ọ bụrụ na o mee otu a nke ga-abụ mbụ a ga akụ ọkpọ mbaụwa n'Afrịka ma e wezuga South Africa. A maala otu nwaanyị ikpe ọnwụ n'Ebonyi Ụlọikpe dị n'Ebonyi Steeti amala otu nwaanyị a kpọrọ Agnes Nwefuru bụ onye gburu nwunye di ya na ụmụ ya asaa ikpe ọnwụ. Ọkaipke Uwabunkonye Onwosi sị na a ga-akwụ nwaanyị a ụdọ maka ịkpọ nwunye di ya na ezinaụlọ ya ọkụ. A tọghapụla nwoke dị afọ 100 a mara ikpe ọnwụ A maala ndị tọọrọ ma gbuo ụkọchuckwu ụka Katolik ikpe ọnwụ Mkpamkpa a mere n'afọ 2017 n'obodo Ishielu dị n'Ebonyi Steeti n'elekere atọ nke isi ụtụtụ mgbe nwaanyị ahụ mụnyere ọkụ n'ụlọ ndị a. Ọkụ a gburu mmadụ asatọ n'ezinaụlọ ahụ mana naanị mmadụ abụọ ka a zọrọ ndụ. Gọọmentị Ebonyi steeti kpọpụrụ nwaanyị n'ụlọikpe maka ichekwa onwe ya na ụmụ ya tupu ọ gbaa nke nwunye di ya ọkụ. JAMB agbarụọla ihu maka agwa ndị Mahadum Jamb ụlọọrụ na-ahụ maka uke ejji aba Mahadum na Naịjirịa Ụlọọrụ ule JAMB agbarụọla ihu etu ụfọdụ mahadum ji e si n'azụ anabata ụmụaka n'ụlọakwụkwọ ha ma kwuo na ha ga-ata mahadum ndị a ahụhụ. JAMB gara n'ihu kwuo na nwata akwụkwọ ọbụla aha ya na-adịghị na websaịt ha mara na ọ nọghị na Mahadum ọbụla. Unu agbazila 'knockout' - Uweojii Enugwu Ndị uweojii Enugwu Steeti adọọla ndị mmadụ ọkachasị ụmụaka aka ntị ka ha ghara ịgba egbe ntụ a kpọrọ 'Knockout' n'oge ekeresimesi a. Ọnụ na-ekwuru ha bụ Ebere Amaraizu sị na nke a bụ maka nchekwa n'obodo. N'ofesi Otu onye oji egbe agbagbuola ihe ruru mmadụ isii n'otu ụlọọgwụ dị na mba Czech Republic ma gbagbuo onwe ya n'akụkọ ebe ahụ. Ndị uweojii hụrụ ozu nwoke a dịka ọ tọgbọ site n'ọnya egbe ọ gbara onwe ya n'isi. N'egwuregwu Pep Guardiola bụ onye bubu onye nchịkọta otu Bayern Munich Onyeisi otu egwuregwu Barcelona bụ Josep Maria Bartomeu sị na Pep Guardiole nwereike ị loghachị na Barcelona ma ọ bụrụ ma ọ chọ. Cheta na Guardiola mere nkeọma mgbe ọ bụ onye nchịkọta Barcelona ebe ọ mabutere ọtụtụ iko. Nkeji ehihie Onyeisiala Buhari ga-aga Ijipt O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Onyeisiala Muhammadu Buharị ga-ahapụ Naịjirịa taa gawa Aswan dị na Egypt maka ọgbakọ a haziri iji wulite udo n'etiti mba Afrịka niile. Ọgbakọ a nke onyeisiala mba Ijipt bụ Abdel Fatta El-Sisi na-ahazi ga-amalite n'ụbọchị iri na otu ruo ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Disemba 2019. Naịjirịa ji ndị ọrụ ngo ijeri naịra 306 n'ụgwọ Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Babatunde Fashola ekwuola na ihe dịka n'ọnwa Ọktoba nke afọ a na ụgwọ gọọmentị etiti ji ndị na-arụ okporoụzọ ruru ijeri narị naịra atọ na isii. O kwuru nke a mgbe otu jịkọtara ndị nwee ụgbọala e ji eme njem kpọtụrụ ya n'isi ụlọọrụ ya dị n'Abuja. N'ofesi Praịm minista mba New Zealand, Jacinda Ardern ekwuola na ọ dịka onweghi onye fọrọ ndụ na mpaghara agwaetiti ọcha e nwere mgbawa ugwu a kpọrọ volcanic eruption. Chaị! ọ dị egwu ooo! A na-eche na n'ime mmadụ iri na atọ o metụtara na mmadụ ise n'ime ha anwụọla pịịị ebe a ka na-achọ mmadụ asatọ achọ. Ọ dịka agbụ enweteghi mmeri kere ndị Arsenal a hapụla ha dịka ha si n'azụ were ọkpụ atọ asatara otu merie West Ham united Nke a ga-abụ mmeri mbụ ha n'ime asọmpi iri ha gbara n'otu usoro. Nkeji Ihe nkiri
[ "Okike", "Ezinụlọ", "Naijiria", "Ikike ụmụnwanyị", "Ntaramahụhụ nke ukwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50683675
Kedụ onye ụtalị mmụọ ga-ada n'azụ ọzọ?
N'ime otu ọnwa, a chụọla ndị nchịkọta ise ọsọ mgbada, kedụ ndị 'hammer' ọchụchụ ga-ada n'isi ọzọ?
2019-12-11T05:29:40Z
Carlo Ancelotti abụrụla onye nchịkọta nke ise a ga-achụ n'ime otu ọnwa
Mauricio Pochetino, Unai Emery, Marco Silva Ajụjụ dị ọtụtụ ndị n'ọnụ ugbua bụ 'kedụ onye nchịkọta ọzọ oge ya ruru ịkwara pụọ?' Nke a bụ maka etu Carlo Ancelotti si sonye na ndị a chụrụ achụ dịka Napoli nyere ya ọsọ n'abalị iri nke Disemba 2019, n'agbanyeghi na o meriri n'asọmpi Champions League. Ancelotti ka banyere n'ihe bụ afọ abụọ dịka onye nchịkọta Napoli, tupu a chụọ ya Ọchụchụ Ancelotti chịkwaburu Chelsea bịara n'ihi na o nwetaghị mmeri n'ime egwuregwu itoolu ikpeazụ Napoli gbarala na Serie A. 'Wheel' Ole ji buru ndị Man Utd ọdapụla daba n'ime ọhịa? Ole ebuliela Mourinho elu mana ọgọdọ ayọchighi ya anya Arsenal achụọla Emery ọsọ mgbada N'otu aka ahụ, ndị mmadụ na-ajụkwa ma Premier League ejizi ụtalị mmụọ apịapụ ndị nchịkọta ha? Ole ebuliela Mourinho elu mana ọgọdọ ayọchighi ya anya Gịnị mere ha ji ajụ ajụjụ a? Ọ bụ naanị onye uche ya na-adịghị n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ bụ onye amaghị na a chụọla ndị nchịkọta anọ n'ime otu ọnwa. Tottenham Mauricio Pochettino nọrọ Tottenham afọ ise tupu a chụọ ya Tottenham malitere egwu oke a mgbe ha sepụrụ Mauricio Pochettinho oche n'otele. Na-erughidị awa 24 e ji chụọ ya, a kpọta 'ọgba afa' nke egwuregwu bụ Jose Mourinho, ka ọ bịa gosipụta ike ya. Arsenal Emery chịkọtara Arsenal naanị otu afọ na ọnwa isii tupu e nye ya ọsọ Na-erughi otu izu, a dọrọ Unai Emery dọpụ n'ezi, sị ya kwara ngwongwo ya lawa. Ha họpụtara Fredrik Ljunberg bụ onye gbabuuru Arsenal bọọlụ n'oge gara aga, ka ọ bụrụ onye nkuzi nchere oge. Mana agbanyeghị nke a, Arsenal ka na-agbakwa ọnyụpa. Watford Sanchez Flores nọrọ naanị ọnwa atọ tupu a chụpụ ya N'ime otu izu ahụ onye nke Watford bụ Quique Sanchez Flores esorokwa ha n'azụ. Nke Flores bụ na ekweghidị ya tụọ ute rahụ ụra tupu a wụọ ya mmiri oyi a iji kpọte ya n'ụra. Florez nọrọ naanị ọnwa atọ n'ọkwa tupu a gbaara ya ụgbọ nwa mkpi. Everton A chụrụ Marco Silva n'ụbọchị Tọzde Ugbua Marco Silva esonyekwala na ndị anamachọọrụ. Oteela atụwara anya na ndị Everton ga-enye Silva ọsọ. Mana ọ bụ mmeri Liverpool meriri ha ụbọchị ụka gara aga ka Ọchụchụ eleghi anya n'azụ a emeela ka ndị mmadụ na-ajụzị sị "Kedụ onye ụtalị mmụọ ga-ada n'azụ ọzọ?" Ndị ọzọ e nwere ike inye ọsọ Manuel Pellegrini Onye ọzọ ọkụ nọ n'ike ugbua bụ Manuel Pellegrini, onye nkuzi ndị Westham. Pellegrini meriri naanị otu n'ime asọmpi asaa ha gbara n'ọdị nso a. Mmeri ha nwetara bụ n'aka ndị Chelsea n'abalị ikpeazụ nke ọnwa Nọvemba. Daniel Farke Ọzọkwa bụ onye nkuzi ndị Norwich bụ Daniel Farke. Naani otu mmeri ka o nweterela n'ime asọmpi asatọ. Akụkọ ga-amasị gị: Mkpọrọ afọ 12 a tụrụ Kalu gosiri na ịgbaba APC abụghị ịgbanarị ikpe - Rotimi Jacobs Usoro enwereike ji chụọ Trump n'ọrụ N'ikpeazu, Sowore e nwerela onwe ya n'aka ndị DSS Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Egwuruegwu", "Premier League", "Bọọlụ", "Arsenal" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50703742
Gịnị na-esere Aisha Buhari na Garba Shehu?
Nke na-ewu ugbua bụ ebubo ole na ole nwunye onyeisiala Aisha Buhari boro Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchitere di ya.
2019-12-11T12:07:13Z
Aisha Buhari: Ihe ise o boro Garba Shehu
Aisha na Garba Akwụkwọ ozi Aisha Buhari degara Shehu Garba, onye ozi onyeisiala Muhammadu Buhari, amụnyela ọkụ na soshal midia. O depụtara na Shehu na-emebiga oke ya dịka onye ozi onyeisiala Buhari. Aisha Buhari gara ileta ndị ụlọ dakwasịrị • Aisha Buhari vs Mamman Daura: Ọ bụ gịnị na-ese okwu n'Aso Rock Aisha Buhari abatala n'ike na ebube Lekwa ihe ndị ọzọ o boro ya O kweghị ka e nwee ụlọọrụ 'first lady' Ọ na-ebuso ezinaụlọ onyeisiala agha site n'ikewapụta akara nzuzo ebe ọ na-esi edepụta okwu ụgha na-emegide aha ya na ụmụ ya. Ọ na-enye ndị na-arụrụ nwunye onyeisiala nsogbu Ọ na-etinye ọnụ n'okwu agbasaghị ya maka ezinaụlọ onyeisiala. Na nchịkọta, nwunye onyeisiala Naịjirịa kwuru na Shehu kwesịrị ịghọta na agaghị anabatazị agwa ya ndị a ọzọ. Mgbe BBC kpọrọ Garba Shehu n'ekwenti, o kwuru na onweghị okwu. Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia @ESAM_XCLUSIVE na-ekwu ka ha kpezie n'ime ọgbakọ nzuzo ha. @MrOdanz kwuru na ụmụ Naịjirịa ekwela ka okwu dị n'etiti ndị be onyeisiala wepụ uche ha n'okwu e ji n'aka. @Morris_Monye kwuru ka Aisha Buhari jide obi ya aka. Akụkụ ndị ga-amasị gị Ecowas court: 'Nnamdi Kanu enweghị ikike ịnọchite ndị otu Ipob' Ihe asaa i kwesiri ịma tupu ị nabata onye odibo
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50744205
Aisha Buhari, Patience Jonathan na nwunye onyeisiala ndị ọzọ ị gaghị echefu ọsịsọ
Ịbụ nwunye onyeisiala na-adịkwa mkpa dịka ịnọ n'oche onyeisiala. Kedụ ihe ndị ị ji echeta ndị nwunye onyeisiala?
2019-12-12T14:04:48Z
Aisha Buhari, Patience Jonathan na nwunye onyeisiala ndị ọzọ ị gaghị echefu ọsịsọ
Ndị nwunye onyeisiala Naịjirịa Oche nwunye onyeisiala na-adịkwa mkpa dịka nke onyeisiala, nke mere na ọtụtụ oge, okwu si ha n'ọnụ pụta na-ebu 'weight'. Dịka nwunye onyeisiala, ụfọdụ ndị nwereike iji ihe ndị si gị n'ọnụ pụta na-atụnyere ọchịchị di gị. Gịnị na-esere Aisha Buhari na Garba Shehu? Ụlọikpe agbawala Patience Jonathan aka Abụzịkwa m 'First Lady' Naịjirịa - Aisha Buhari Nke a apụtala/pụtara ihe n'ọchịchị ndị dịka Muhammadu Buhari, Goodluck Jonathan na Turai Yar'Adua, ebe okwu nwunye ha gbara ọtụtụ ndị gharịị. Lee ihe ndị ị nwereike iji echeta ndị nwunye onyeisiala ndị a: Aisha Buhari: Aisha Buhari a mụrụ n'ụbọchị 17 nke ọnwa Febrụwarị, 1971 bụ nwunye Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'oche ọchịchị Naịjirịa nke ugboro abụọ ugbua. Oge ha malitere ọchịchị n'afọ 2015, e kwuburu na agaghị enwe ihe ọbụla dị ka "ụlọọrụ nwunye onyeisiala", mana nke ahụ gbanwere n'ọnwa Juun 2019 mgbe o kwuru sị kpọwazịkwaa ya 'first lady'. A bịa n'ikwuputa okwu banyere ọchịchị, o jighikwa ya n'ọnụ makana ọtụtụ oge ka o kwuputarala ihe na-eme n'ọchịchị di ya; o bola nwanne di ya bụ Mamman Daura ebubo ịpị di ya ka 'remote'. Ihe ọzọ tụrụ ndị mmadụ n'anya bụ etu o si kwuo na Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuru di ya anaghị arụ ọrụ e dinyere ya. Buhari bụ di ya ekwuola na Aisha ekwesịghị itinyere ya ọnụ n'ọchịchị, na ọ bụ n'ime ụlọ ka ọ kwesịrị inwe ọnụ. Patience Jonathan: Patience Jonathan a mụrụ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọktoba 1957, bụ nwunye Goodluck Jonathan chịrị Naịjirịa site n'afọ 2010 ruo 2015. Oge ha nọ n'ọchịchị, onye ọbụla ma na ọ naghị eji Jonathan egwu egwu, ọkachasị maka etu ọ na-esi agbachitere ya ọgụ ma ndị mmadụ kpụkarịa ya n'ọnụ etu na-adịghị mma. N'onwe nke ya, 'Mama P' bụ ihe ndị mmadụ na-akpọ ya, metara ihe ndị e ji echeta ya. Ị nwereike ichefu "Chai! There is God oo" bụ akwa o bere mgbe ọ na-ekwu maka ụmụakwụkwọ ndị Boko Haram tọrọla? Ka ọ bụ mgbe o kwuru na "unu tụnyere Buhari na ntuliaka, o merie, unu ga na-aga eleta di unu n'ụlọmkpọrọ" ka ha gara ọgbakọ ebe a na-arịọ vootu n'afọ 2015? Onye ọbụla ma ụdịrị ike nwaanyị Rivas steeti kpara oge ha nọ n'ọchịchị. Kwa mgbe ka a na-echeta ya ugbua, ọkachasị mgbe gọọmentị tụlitere okwu nnyocha ego ole ha sị na ha butere n'ọchịchị ha. Turai Yar'Adua: Turai Yar'Adua a mụrụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị 1957, bụ nwunye Umaru Musa Yar'Adua chịrị Naịjirịa site n'afọ 2007 ruo mgbe ọ nwụrụ n'afọ 2010. Oge ha nọ n'ọchịchị, ndị mmadụ na-ekwu na o so na ndị di ya na-ege ntị tupu o mee ihe ọbụla, dịka iwe mmadụ n'ọrụ. N'ihi ụdịrị ike a na-ekwu na nwaanyị a kpara, akụkọ kwuru na oge di ya nwụrụ, na o kwuputaghị ya n'oge maka na ọ chọrọ ihazicha ihe tupu ọ pụọ n'ọchịchị. Stella Obasanjo Stella Obasanjo a mụrụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Nọvemba 1945, bụ nwunye Olusegun Obasanjo chịrị Naịjiria site n'afọ 1999 ruo 2007. Tupu ya na di ya abanye n'ọchịchị, o so na ndị ọnụ na-eru n'okwu banyere ime mkpesa maka mgbanwe ọchịchị nke Bekee kpọrọ "political activist". Oge ọ dị ndụ, ọ bụ nwaanyị na-etiputa 'style'. Ọ na-eke ekike mere o ji achakapụta n'ọha. Obasanjo chịzuru afọ abụọ ya n'agbanyeghi na nwunye ya nwụrụ n'afọ 2005. Ọ nwụrụ ka ọ gara ịwa ahụ nke a kpọrọ 'plastic surgery' na Bekee. Maryam Abacha Maryam Abacha a mụrụ n'ụbọchị anọ nke ọnwa Maachị 1945, bụ nwunye Sani Abacha chịrị Naịjiria site n'afọ 1993 ruo 1998. Abacha chịrị oge Naịjirịa ka nọ n'okpuru ọchịchị ndị agha, mana ọchịchị ya adabaghịrị ndị Naịjirịa, nke mere na oge ọ nwụrụ n'afọ 1998, ndị mmadụ wụbara n'ụzọ na-amali elu, na aṅụrị. N'afọ 1999, Maryam kwuru na n'agbanyeghi ihe niile ndị mmadụ na-ekwu maka di ya, na ọ hụrụ Naịjirịa n'anya nke ukwuu. Maryam Babangida Maryam Babangida a mụrụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba 1948 bụ nwunye Ibrahim Badamasi Babangida chịrị Naịjirịa site n'afọ 1985 ruo 1993. Akụkọ na-ekwu na ọ bụ ya kewapụtara ọkwa 'first lady' na Naịjiria site n'ịbụ onyeisi ndị nwunye ndị agha, ebe o si wee hibe ọtụtụ ihe na ụlọọrụ na-enyere ụmụnwaanyị aka. O mere ihe mere ọha ji buru ya n'isi ghara ị na-akatọ maọbụ ekwutọ ya; ọ bụghị naanị na Naịjirịa, ma na mpaghara Afrịka dị iche iche. Dịka nwunye onyeisiala, ekike ọ na-eke bụ 'Igbo bịa lelee", nke bụ na ọ bụ 'olu gbajie ọha'. Nna ya bụ onye Igbo si Asaba, ebe nne ya bụ onye Awụsa. Ọrịa Kansa gburu ya n'afọ 2009. Kedụ nke kacha masị gị? Akụkọ ga-amasị gị: Ndị ọrụ ọkụ latrik akagbuola abubụọrụ ha Gịnị na-esere Aisha Buhari na Garba Shehu? Ihe i kwesiri ịma maka Naira Marley Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ikike ụmụnwanyị", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50758913
Uru na ọghọm dị na ndị Afrịka ọzọ ịgba aka 'Visa' bata Naijiria
Ihe nrite dị na Naijiria inye ndị Afrịka ndị ọzọ akwụkwọ n'ọnụụzọ ama ha.
2019-12-12T18:06:13Z
Nigeria Visa: Uru na ọghọm dị n'inye ndị Afrịka 'visa' n'ọnụ ama Naijiria
Ndị mbịara mbịara Onyeisiala Muhammadu Buhari kwupụtara na nso nso na Naịjirịa, site n'afọ 2020 gawa ga-enye ndị Afrịka na-abata akwụkwọ njem (Visa) n'ọnụ ama Naịjirịa. Amụma a nke sitere n'atụmatụ 'Africa Free Trade Agreement' nke birila ọkụ, ọ ga-eme ka njem n'etiti mba ndị Afrịka ọzọ na Naịjirịa dị mfe. Africa Free Trade Agreement: Ihe ise ị kwesiri ịmata Ị ma ego ole ị ga-eketa ma e kee ụgwọ Naịjirịa ji ugbua? Cheta na Naịjirịa binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta n'ọnwa Julaị afọ 2019. Raphael James bụ onyeisi ụlọọrụ na-eme nchọpụta na nhazi ozi a kpọrọ, "Center for Research, Information Management and Media Development (CRIMMD)' na bekee kwuru na o nweghị ihe dị n'isi azu. Na nkọwa ya,"Na mbụ mmadụ nwere ike ịbata maọbụ hapụ Naịjirịa na-ejighi akwụkwọ ọbụla." "Ndị a ha na-agwa bịa kwụwa ụgwọ 'visa' na-abatabu na-ejighi akwụkwọ ọbụla." Ihe Buhari ji kagbuo njem Rwanda Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara "Mmadụ na-enubata Naijiria n'igwe mbụ, naanị ndị nwere agba ka ọ na-ara ahụ inweta akwụkwọ eji abata ala Naijiria." Uru ọ dị n'atụmatụ a? Ndị na-ahụ ihe gbasara akụnaụba nakwa mmekọrịta mba na mba dịka Boniface Chizea,Richard Mammah na Raphael James kwuru na uru dị na ya gụnyere: Ọ ga-emeda ndị Afrịka ndị ọzọ obi dịka ụfọdụ na-ewe iwe maka Naịjirịa gbachiri ụzọ e si abata n'ala ha. Ọ ga-enyere mmekọrịta mba na mba n'Afrịka aka ka ndị mba ọzọ were anya ndị Afrịka ndị ọzọ ga na-enweta akwụkwọ njem na-egbughi oge ọbụla. Naịjirịa ga na-enweta ego site n'inye ndị Afrịka ndị ọzọ chọrọ akwụkwọ njem. James si, "Mba Kenya na-anata dọla iri ise ($50) iji nye mmadụ visa dịka ha na-azọchi n'ama." "Nke a na-aba n'akpa gọọmenti ozugbo ozugbo." Ọghọm dị na ya? Ndị ihe a na-ekwu doro anya kwuru na ọghọm dị n'atụmatụ ahụ karịrị uru dị ya. Enweghị ọrụ Ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba bụ Boniface Chizea kwuru na "Naịjirịa buru ibu mana akụnaụba Naịjirịa anaghị eto eto ugbua." "Enweghị ọrụ ka bụ nnukwu nsogbu." Nsogbu nchekwa Chizea gbara ama na nsogbu nchekwa chere Naịjirịa aka mgba ga-akawanye njọ ma e bido imezu atụmatụ ọhụrụ gọọmentị gbasara inye ohere ka ndụ Afrịka ọbụla bịawa Naịjirịa. "Ohi, ntọ, na mpụ bụzi ụzọ e si akpata ego, ị na-akwadokwa ịkpọbata ndị ọzọ ga-abịa chọkwa ọrụ." Nrụrụaka Ha kwuru na nrụrụaka agaghị enye ohere ka Naịjirịa nwete ego site n'inye ndị mmadụ akwụkwọ njem n'ihi nrụrụaka. Akụkọ ga-amasị gị: Ọ ginịdị ka Soludo na ibe ya ga-arụrụ Buhari? Ihe 7 ị ga-eji cheta ndị Naịjirịa ma ị zute ha n'ụgbọelu Ihe na-echere ndị Naịjirịa akamgba ikwụ ụgwọ ụtụ isi
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Njem", "Njem nleta", "Ahịa", "Njem" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50774244
Ihe mmeri Boris Johnson pụtara n'okwu Brexit?
Okwu Brexit so n'isi okwu eji mee ntuliaka e mere na Briten
2019-12-13T11:37:26Z
UK Election : Ihe mmeri Boris Johnson pụtara n'okwu Brexit?
Boris Johnson Onyeisi pati Conservative na mba Briten bụ Boris Johnson ekwuola na ya ga-akwụghachị ndị turu pati ya vootu na ntuliaka e mere iji hopụta pati ga-achị mba ahụ. Pati Johnson nyere ndị na-azọsị ha ọchịchị bụ Labour pati mmeri pụrụiche dịka ha meriri ha ma n'ebe a na-ahụ ka ebe ndi kwadoro ha ka. N'okwu Praim Minista Johnson kwuru ka a na-eche ka a kpọọ onye meriri oche abụo fọrọ, ọ sị na mmeri pati ha gosiri na ndị Briten kwụ ya n'azụ n'okwu Brexit. Jeremy Corbyn bụ onyeisi Labour pati n'onwe ya kwenyere na pati Conservatives kurur ha isi aba okpu na ya bu ntuliaka. Ọ sị na ya agaghị abụ onyeisi pati Labour ruo oge a ga-eme ntuliaka ọzọ. Kedu ihe mmeri a pụtara? Jeremy Corbyn sị na ya agaghị anọ n'isi pati Labour ruo ntuliaka ọzọ Okwu akpụ n'ọnụ were banye ntuliaka bụ Brexit. Boris Johnson so n'ime ndị kwadoro atụmatụ Brexit a nke butere ntuliaka eji jụọ ndị mmadụ ma ha achọrọ ịnọ n'EU maọbụ ha chọrọ ipụ. Ntuliaka a emere n'usoro "referendum" kpọtụru n'ụbọchị 23 nke ọnwa Juun afọ 2016. Ka emechara ntuliaka a ndị chọrọ ka Briten pụọ na EU ji pacenti 52 merie ndi chọrọ ka anọdụ nwetere pacenti 48. David Cameron - bụ onye na-achị n'oge ahụ - rituru n'ọkwa nke mere ka Theresa May malite ọchịchị. Theresa May rituru n'ọkwa ka agbajọrọ atụmatụ Brexit ya ugboro atọ Mbo niile Theresa May gbara ịhụ na Brexit mere amịtaghị mkpụrụ nke mere ya onwe ya jiri rituo n'ọkwa. Boris Johnson rigoro n'ọkwa were malite njem Brexit a mana atụmatụ owepụtara adabaghị. Ugbua ọ na-ahụ mmeri onwetere na ntuliaka a dịka ikike ọha nyere ya ị ga n'ihu mee Brexit n'usoro ọ chọrọ. Ọkọrọtọ Briten na nke EU Gịnị bụ Brexit? Brexit bụ atụmatụ mba Briten jiri chọọ ịpụ na mmekọ mba Yurope akpọrọ "European Union" (EU). Brexit pụtara - "British Exit" - nke bụ ọpụpụ Briten na EU. Kedu ndị so n'European Union Ọpụpụ n'EU ka eme ka ndị Briten na-eji visa aga Yurope Mba 28 so n'ime EU. Atụmatụ a na-enye ha ohere ịtụ mgbere na mmadụ ịgagharị na mba ọbụla ha chọrọ na-enweghi nsogbu. Mba Briten banyere EU n'afọ 1973 (n'oge ahụ, ama ya ka "European Economic Community). Yabụrụ na UK pụrụ, ha ga-abụ mba mbụ si EU pụọ.
[ "United Kingdom", "Naijiria", "Brexit" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50760194
Imerienwe, Obinkita, Ajatakiri na obodo ndị ọzọ aha ha adịghị mfe ịghọta
Obodo dị iche iche na-enwe ihe kpatara e ji gụọ ya ụdịrị aha a gụrụ ya, mana kedụ ndị ka agbagị gharị ịghọta?
2019-12-14T07:21:21Z
Igbo Town Names: Ị ma etu aha ụfọdụ obodo dịka Imerienwe, Dikenafai na ndi ọzọ siri bịa?
Ebe na-egosi Ukpor Gịnị mere e jiri gụọ ụfọdụ obodo aha ha na-aza? Ndị Igbo anaghị agụ aha ka ọ bụrụ na ha gụrụ aha, kama ha na-ama ụma gụọ aha nwere nkọwa na mpụtara Nnewi, Awka na obodo ndi ọzọ nwere anụmanụ ha na-akwanyere ugwu Ihe ị kwesiri ịma maka okpueze ala Igbo Ị ma ihe bụ njirimara ndị Ozalla? A bịa n'obodo ndị dị n'ala Igbo, ụfọdụ nwetara aha ha site n'aha onye bidoro obodo ahụ, ebe ndị ọzọ nwetere aha ha site n'ihe ha gabigara mgbe gboo. Mana a bịa n'aha obodo na-aza, ụfọdụ bụ ndị ị ga-aghọta aha ha ozugbo ị nụrụ ya, ebe ndị ọzọ ga-eme ka ị kọo ọkọ n'isi ma taa aka n'eze tupu ị mara ihe ọ pụtara. Aha ụfọdụ obodo ndị ahụ: Ọ bụghị na aha obodo ndị a ga-atọ gị ọchị, kama ọ bụ na o nwereike ịra gị ahụ nghọta dịka onye Igbo, maọbụ gbaa gị gharịị dịka onye esighi obodo ahụ pụta maọbụ mara ihe nwere aha ahụ. Ọzọkwa bụ na aha obodo ndị a akọwaghị onwe ha dịka ndị ọmụmaatụ, Ụmụọpara, Ụmụoji, Enugwu, nakwa ndị ọzọ dị ka ha. Chokoneze: Ọ dị na mpaghara Ezinihitte dị na Mbaise dị n'Imo steeti. Aha ha si n'obodo abụọ bụ "Ụmụchoko" na "Ụmụeze". E mechaa kpokọọ ya ọnụ. Ndịkelịọnwụ: Ọ dị na mpaghara Orumba Nọt dị n'Anambara steeti. Aha a bụ mkpokọta "ndị" na "Ikeliọnwụ". Nkọwa ya pụtara na e nweghi ike na-egbochi ọnwụ. Ejemekwuru: Nke a bụ aha otu obodo dị n'Ugwuta dị n'Imo steeti. Aha a pụtara na enweghị ụdịrị mmadụ ị gaghị ahụ ma ị garuo obodo ahụ. Dikenafaị: Ọ bụ obodo dị n'Ideatọ dị n'Imo steeti. Imerienwe: Ọ bụ aha a kọwapụtara site na nsọ obodo ahụ na-asọ enwe. Obodo a dị n'Imo steeti. Isuikwuatọ: Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-akpọghie aha obodo a dị n'Abịa steeti (ụfọdụ na-akpọ ya Isi-Ukwu-Atọ). Ekwereazụ: Obodo a dị n'Imo steeti. Abazụ: Ọ bụghịkwa maka azụ dị na mmiri o. Ọ pụtara "anyị na-aba, anyị a na-azụ". Obodo a dị n'Ọgwa dị n'Imo steeti. Isiekenesi: Nke a si n'ime otu n'ime ahịa anọ dị n'ala Igbo (Eke). Orlu-Gedegwum: Obodo a dị n'Ọlụ dị n'Imo steeti Obibiezena: Obodo a dị n'Imo steeti Abodinoso: Obodo a dị na Mbaise dị n'Imo steeti Ajatakịrị: Obodo a dị n'Abịa steeti Ụmụcheikuku/Nnalane-Okorocha/Ụmụalaji Ụmụber-Leche/Elekenowasi: Ndị a bụcha aha obodo dị n'Aboh Mbaise dị n'Imo steeti. Obinkịta: Ị nwereike ịkpọ ya obi (mkpụrụobi), mana ihe ọ pụtara bụ 'obi' (mbara). Ọ bụ obodi dị n'Arọchukwu dị n'Abịa steeti. Egwudulegu: Obodo a dị n'Ebonyi steeti. Oguzaronweya: Nke a bụ obodo dị n'Ebonyi steeti. Dịka aha ahụ siri kọwaa, ọ pụtara 'obodo guzoro onwe ya'. Mkpuma akwaokuku: Gịnị ka ọ dị gị ka aha obodo a pụtara? Obodo a dị n'Ebonyi steeti. Awkunanaw: Obodo a dị n'Enugwu steeti Nchatancha: Obodo a dị na Nike dị n'Enugwu steeti Amankpunator: Obodo a dị n'Enugwu steeti. Akụkọ ga-amasị gị: Aisha Buhari, Patience Jonathan na nwunye onyeisiala ndị ọzọ ị gaghị echefu ọsịsọ Uru na ọghọm dị na ndị Afrịka ọzọ ịgba aka 'Visa' bata Naijiria Ọ bụ mmadụ abụọ, ọ bụghị asaa ka nwaokorobịa gburu n'Imo steeti - Uweojii Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Abia Steeti", "Enugu Steeti", "Omenala", "Anambra Steeti", "Ebonyi Steeti", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50802091
'PEPEsoup' oke ọnụahịa Arsenal agbaala ụka n'azụ ụlọ ha
Arsenal riri ọkpụ goolu atọ characha n'aka Manchester City n'asọmpi Premier league.
2019-12-15T18:35:39Z
Arsenal vs Man City: 'PEPEsoup' oke ọnụahịa Arsenal agbaala ụka n'azụ ụlọ ha
Pepe na-agbara Arsenal bọọlụ Manchester City ji iwe ọnyụpa ha gbara kamgbe izuụka sị ka ha kugbuo ndị Arsenal n'ihu 'nne na nna ha'. Ha asọghị anya na ha bịara n'ụlọ Arsenal ma jiri ọkpụ goolu atọ characha a na-asataghị otu merie ha n'asọmpi Premier league. Arsenal ọ na-agbazi okirikiri n'ukwu ose? Ekwe ndị Lyon akụọla Arsenal n'isi N'ime nkeji 2 ka Man City malitere tiwe Arsenal manwụ site na goolu Kevin De Bruyne nyere. A ka-akpụ nke ahụ n'ọnụ mgbe Raheem Sterling mezuru ya goolu abụọ na nkeji 15. Tupu Arsenal na-ama nke egwu na-akụ nwamadị a bụ Kevin De Bruyne gbakara neetị ọzọ na nkeji 40. N'agbanyeghi Arsenal nwara ike mana ọ dịka a ga-asị ha bụ 'Oji ọnụ agba egbe'. Ugbua Arsenal nọ n'ogogo itoolu na tebụlụ Premier league ebe Man City bụ ndị atọ. Manchester United lara na nta ọnya Everton Orie gaara ala n'isi Manchester United dịka ha nabatara Everton n'ụlọ ha n'asọmpi Premier League. Ihe mgbe Man. United si n'aka mgbe onye otu ha bụ Victor Lindelof nyere onwe ha goolu na nkeji 36. Newcastle e gosila Man U na ha bụ dike bọọlụ Everton abọkasịala Man United ka ọkụkọ 'Easter' Ngwa ngwa nke a mechara, Everton kwechiri, mee ka ọ raa Man. United ahụ ịzsa goolu ahụ. Man. United sigidere ọnwụ ruo na nkeji 77 mgbe obere ụzọ neetị mepere site n'aka Mason Greenwood. Nke a mere Manchester United na Everton jiri were otu ọkpụ goolu gbaa onye lawa onye lawa. Manchester United alaghachịla n'ogogo nke isii na tebụlụ bụ nke ọtụtụ na-asị na e jiri mara ha. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Kamaru Usman: Dimkpa Naịjirịa nwere 'single bone' eturula ugo Imerienwe, Obinkita, Ajatakiri na obodo ndị ọzọ aha ha adịghị mfe ịghọta
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Manchester United", "Bọọlụ", "Arsenal" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50806433
Ihe mere ụmụnwaanyị Ebonyi ji gbara ọtọ mee ngagharịiwe
Ụfọdụ ụmụnwaanyị sị n'Agubia nke Ikwo dị n'Ebonyi Steeti gbaọtọ mee ngagharịiwe n'Abakiliki.
2019-12-16T08:23:41Z
Ebonyi State: Ihe mere ụmụnwaanyị ji gbara ọtọ mee ngagharịiwe
Foto a abụghị nke ụmụnwaanyị Ebonyi Akụkọ pụtara na ụfọdụ agadi ụmụnwaanyị ruru otu narị sị na Agubia dị n'Ikwo gbaọtọ ma buru ngagharịiwe gaa n'isi ọchịchị Ebonyi steeti. Akụkọ sị na Ụmụnwaanyị a kpọrọ oku sị ka gọvanọ Dave Umahi nye iwu ka ndị uweojii tọhapụ ụmụ ha bụ ndị uweojii nwụchiri. Gịnị ka ị ma maka 'Aba Women's riot' mere afọ 90 gara aga? Ụmụnwaanyị Aba emeela ngagharịiwe maka ajọ ụzọ Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah sị na o juru ya anya ịhụ ụmụnwaanyị a na-eme ngagharịiwe. Ọ sị na a nwụchiri ụmụ ha maka ọgbaghara mere n'izuụka atọ gara aga ebe ha kpọrọ ụfọdụ ụlọ nakwa ụgbọala ọkụ. Na okwu ha ka nọ n'ụlọikpe ugbua. Ọ sị ngaghariiwe a na-egosi na ụmụnwaanyị a na-akwado ihe ọjọọ ụmụ ha na-eme. BBC Igbo kpọrọ gọọmentị Ebonyi Steeti mana ha sị na ha anụghị maka nke a. Ihe anyị ga-eji kwado mbite ego - Onyeisi ụlọomeiwu Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan kwuru na nkọwa Buhari nyere maka mbite ego ahụ doro ha anya Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan akọwaala ihe ha ga-eji kwadoo arịrịọ maka mbite ego ọhụrụ bụ nke onyeisiala Muhammadu Buhari rịọrọ ha. Lawan nyere nkọwa a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja n'ụbọchị Mọnde. Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ gbasara budget 2020 Ọ bụ atụmatụ ibite ego n'ofesi anyị gbajọrọ ka Buhari wetekwara ọzọ - Shehu Sani Ị sonyere n'ime ndị dara ogbenye? Ọ kọwara na ha bụ ndị omeiwu ga-akpachapụ anya iji hụ na ego ahụ ga-aba n'ọrụ. Cheta na ụlọomeiwu nke gara aga ekweghị akwado ka Buhari bite ego ahụ. N'oge ahụ, Bukola Saraki onye bụ onyeisi ụlọ omeiwu ukwu na ndị otu ya jụwara isi na gọọmentị agaghị ebite ego ahụ. Bukola Saraki akwadoghị mbite ego ahụ oge ọ bụ onyeisi ụlọ omeiwu Mana Buhari weghachiri arịrị ahụ azụ n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Nọvemba. Lawan kwuru na ihe kpatara ndịomeiwu ji kagbuo atụmatụ mbite ego ahụ n'oge gara aga bụ maka na onyeisiala akọwaghịrị ha ọfụma. O kwuru sị, "ugbua, ha akọwaala ya nke ọma. O doola anya ihe ha chọrọ iji ego ahụ mee." Ụlọikpe akụchapụla akwụkwọ a gbara Ganduje A na-ebo gọvanọ Ganduje ebubo ịna aka azụ Ụlọikpe na Kano akụchapụla akwụkwọ otu onye ọkaiwu gbara gọvanọ Umar Ganduje gbasara ebubo iri ngari. Ọkaiwu ahụ chọrọ ka ụlọikpe nye iwu ka EFCC nyochaa Ganduje, mana ụlọikpa kụchapụrụ ya n'ihi na iwu Naịjirịa akwadoghi inyocha onye ji ọkwa Gọvanọ. Ọgụ adaala na Pako dị n'Aguda, Surulere Ọtụtụ mmadụ anwụọla n'ihi tigbuo na zogbuo dapụtara n'ebe a na-akpọ Pakọ, Aguda dị na Surulere Lagọs. Onye ntaakụkọ BBC bi nso n'ebe ahụ sị na ọ bụ ndị na-azọ onye ga-abụ onyeisi ndị ntoroọbịa na-alụ ọgụ. Ọgụ shịịte eriela isi onye ntaakụkọ Channels Ihe butere ọgbaaghara na mpaghara Abule Egba na Lagos - Ndị uweojii O kwuru na a lakwara ọtụtụ ngwongwo na ụlọ obibi ndị mmadụ n'iyi. Otu onye ọzọ bi na gburugburu ebe ahụ sị na ụlọọahị niile sị n'ebe ahụ agbachiela. Okwe Champions League agbaala N'egwuregwu, a tụọla akwụkwọ nke Champions League taa ị mata ndị ga-ezute ibe ha na agba nke otu egwubọọlụ iri na isii foduru. N'ime ya Borussia Dortmund nke Germany ga-ezute Paris Saint Germain nke France, Real Madrid nke Spain ga-ezute Manchester City in England. Etu ọ sọrọ ụwa ya mee, Arsenal gba aka iko n'afọ a Brighton asapụla Tottenham ọcha ka azụ ite Atalanta BC nke Italy ga-ezute Valencia CF nke Spain. ClubAtletico de Madrid nke Spain ga-ezute Liverpool FC nke England. Chelsea FC nke England ga-ezute FC Bayern Munchen nke Germany. Olympique Lyonnais nke France ga-ezute Juventus nke Italy. Tottenham Hotspur nke England ga-ezute RB Leipzig nke Germany, ebe SSC Napoli nke Italy na ndị FC Barcelona nke Spain ga-agwu. N'otu aka ahụ ka Arsenal, Celtic nakwa Manchester United ga-amata ndị ha ga-agba n'asọmpị Europa League mgbe a ga-atụ akwụkwọ ha n'ehihie taa bụ Monde. A ga-amalite ịgba Champions League n'ọnwa Febụwaị afọ 2020. Ụmụejima anọ awuchie n'Enugwu Ụzụ tụrụ na Mother of Christ Specialist Hospital Enugwu ụbọchị Satọde mgbe otu nwaanyị mụrụ ejima anọ. Akụkọ anyị nụrụ bụ na Enugwu gbara ụmụaka ahụ nkiri ka akụkọ ha banyere obodo ahụ. Ụfọdụ n'ime ha gakwara ebe ahụ ịkụrụ ya bụ onyinye nke mkpụrụ afọ n'aka nne ha. Nna ụmụ ejima ahụ bụ Cajetan Adiele sị na ọṅụ jụrụ ya afọ ọkachasị ka isi nwụnye na ụmụ ya gbara iche n'udo. Adiele sị na nke a bụ afọ ime mbụ kemgbe ha gbachara akwụkwọ na ọnwa ọktoba 2018. Ọkụ agbaala n'Ibadan Ọkụ ọgbụgba N'ime abalị sọnde ka ndị mmadụ na-ekwo ụra ka ọkụ tapịara ngwa ahịa dị nde kwuru nde nke ụmụ mmadụ n'Ibadan dị n'Oyo steeti. Ndị mmadụ na-eche na ọ bụ mgbe ndị 'Ibadan Electricity Distribution Company' wetere ọkụ bụ mgbe ya bụ ọkụ bidoro. Ọgbaaghara n'India India N'ofesi, Onyeisiala mba India bụ Narendra Modi arịọla ka udo chiaa maka ọgbaghara na-arị ibe ya elu na mba ahụ kemgbe abalị ise. Ndị mmadụ malitere ngagharị iwe maka iwu ọhụrụ etiri n'India bụ nke nwere ikike ka ndị abụghị ndị ụka alakụba nwee ike ịbata na India. Lee ka o si kwuru na Champions league afọ a Akwa akwụọla ọzọ n'OAU OAU Ah! Onyenkuzi ọzọ bụ Victoria Adeniyi alaala mụọ nke mere ya onyenke atọ n'ime otu izuụka. Victoria tupu ọ laa mmụọ bụbu osote onyeisi na ngalaba mahadum ahụ na-amụ maka ejije bụ Department of Dramatic Arts. OAU: Kpụpụ ọkammụta Akindele ụlọịkpe - ICPC chetakwa na ndị omekome gbagburu Jerome Elusiyan abalị atọ gara aga. Tupu nke a eme, ahụrụ Dr Nicholas Igbokwe ebe ọzu ya dọ na ọfis ya. Dịka ọ dere n'akwụkwọ, onye na-ahụ maka mekọrịta Mahadum ahụ na ndị ọzọ bụ Abiodun Olanrewaju, o kwuru na " ọ dị anyị nwute ka ọnwụ sịrị napụ anyị onyenkuzi ọzọ aha ya bụ Victoria Oluwaremilekun Adeniyi ka o ruchabeghị abali abụọ Jerome Elusiyan hapuru." Akụkọ kọrọ na ọ bụ Victoria hazichara ihe ejije ndị mahadum ahụ gosiri abali anọ gara aga ma sokwara mee ngagharị ngosi ndị ọkankuzi mere ha jiri pụta ọgbọ na nzuko nke iri anọ na anọ nke mahadum ahụ. Ndị NIMC akwadoola abụbụ ọrụ Ndị ọrụ ngalaba Goomentị na-ahu maka njirimara bụ National Identity Management Commission ekwuola na ha adịla njikere igba abụbọ ọrụ maka ụgwọ eji ha na nleghara anya gọọmetị leghara ha. Onyeisioche ndị ọrụ a bụ Lucky Asekokhai gwara ndi ntaakụkọ na ha na-enye gọọmentị ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa desemba 2019 imegharị ọnodụ ha ma ọbụghi ya ka ha ga dọghachị azụ. Edgar Lungu sị Amerika laa be ha Edgar Lungu onyeisi mba Zambia Onyeisiala Zambia bụ Edgar Lungu agwala ndị Amerịka ka ha kpọrọ onye nnọchite anya ha n'obodo ahụ bụ Daniel Foote maka okwu okwuru megide nga ha turu ụmunwoke abụo maka mmeko nwoke na nwoke. Lungu sị na ọchọghị ndi dika foote na mba ha . Ma cheta kwa na iwu Zambia megidere mmeko nwoke na nwoke. N'egwuregwu Mgbe Manchester City mere Arsenal mmiri chukwu na be ha (Emirate) ụbọchị ụka Otu egwu bọọlụ Manchester City ejirila iwe gbanye ndị Arsenal kpakpando n'anya dịka ha ji ọkpụ goolu atọ ha asataghị chaa chaa merie ha. Mmeri a budatara Arsenal n'ọnọdụ ndị nke itolu na Premiership. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị 'PEPEsoup' oke ọnụahịa Arsenal agbaala ụka n'azụ ụlọ ha Kamaru Usman: Dimkpa Naịjirịa nwere 'single bone' eturula ugo Imerienwe, Obinkita, Ajatakiri na obodo ndị ọzọ aha ha adịghị mfe ịghọta
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ọmụmụ na mmụta", "Zambia" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50809106
Ọ bụ eziokwu na a chuturu igwe ndị Ekwulobia?
Ndị obodo Agba nke dị n'Ekwulobia ekwuola na ha agaghị enwezi ndị nnọchite anya n'obi igwe makana ha sị na igwe ha achọghị udo.
2019-12-16T13:20:28Z
Ekwulobia Royal Stool: Ọtụtụ ndị obodo Agba gbara igwe ha alụkwaghị m
Ndị ichie Ndị mmadụ na-achọ imata nke bụ eziokwu n'esemokwu dị n'etiti ndị obodo Agba dị n'Ekwulobia na Igwe ndị Ekwulobia bụ Igwe Emmanuel Onyeneke. Akụkọ pụtabụrụnụ na-ekwu na ndị Obodo Agba kwuru na ha na Igwe ha agaghị enwe mmekọ ọbụla. Ndị omekome amụtala ọzọ n'Anambra Onye Igbo abụrụla 'Mayor' na London Nke a mere ka BBC gbaa onye chibụru dịka onyeisioche 'Agba Development Union" nke ngalaba Legos ma chikwaa dịka onyeisioche ngalaba ehiwere maka udo na Ekwulobia bụ Chibueze Ezegwu ajụjụ maka ihe na-eme. Ezegwu kwuru sị " Kamgbe Igwe banyere n'oche Eze, nsogbu dị, mgbe ọbụla a sị ka-eme ụdo, ịgwe na-ajụ", N'afọ 2016 ka ndị ofufe dị iche iche biara ikpe udo mgbe Igwe na ndị otu ya kpọrọ ha ka ha kpee udo. O kwukwara na mgbe ndị ofufe a mechara nyocha ha, ha gosiri ya ndị Ekwulobia nke Igwe kwenyere. Ọnwụ Igwe: Ụmụokoroọbịa Akpugo agbaala ọsọ Ndị gburu Paul Offu na Clement Ugwu nọzị anyị n'aka - Uweojii Enugu Kama mgbe ọ lara ọ megharịrị ma jụ nchopụta ndị otu udo a mere. Nke mere ka ndị obodo Agba nwee nzụkọ ma mee ntụliaka imara ma ha a ga akwụsị i ga be Igwe. Mmadụ narị abụọ na otu kwetere na ha agaghi enwezị ndi nnọchite anya n'obi Igwe ebe mmadụ abụọ kwenyere na ha ga-enwe ndị nnọchite anya na nke Igwe. Mgbe ha kpebiri nke a , ha degara Igwe na ndị Ekwulobia niile akwụkwọ ma gwa ha ebe ndị Agba kwụ. Ezegwu kwuru sị " Anyi degara Igwe na ndị Ekwulobia akwụkwo gwa ha na ndị Agba agaghị enwe ndị nnọchite anya na nke Igwe ruo mgbe ọ bụla igwe chọrọ udo" Mbo niile BBC gbara inweta Igwe Emmanuel n'ekwentị amụtaghi mkpụrụ. Akụkọ ka na-abịa. Akụkọ ga-amasị gị Ihe mere ihe nkiri Netflix na-adọrọ okwu Mmadụ atọ anwụọla na Mahadum Obafemi Awolowo n'otu izuụka Ndị uweojii atọhapụla Duncan Mighty 'Ụmụakwụkwọ FUTO tọrọ na Croatia ga-alọta mgbe n'adịghị anya' - Abike Dabiri
[ "Naijiria", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50810146
Ụwa ekwerela na ụmụnwaanyị isi ojii bụ dachịị?
Miss Universe, Miss World, Miss USA, Miss America sọ n'ime ndị nọ n'aka ndị isi ojii ka ndị mmadụ na-ekwu n'ụwa atụgharịala etu o si kwesi.
2019-12-16T13:41:01Z
Miss World and Miss Universe: Ụwa ekwerela na ụmụnwaanyị isi ojii bụ sọ mma?
Miss World, Miss Universe, Miss USA Ọ bụ n'abalị iri na anọ nke ọnwa Dicemba ka Toni-Ann Singh bụ nwaafọ Jamaịka tuuru ugo dịka nwaanyị kachasị mma n'asọmpi Miss World. Mmeri nwaada Singh mere ya ugo ise pụrụche ndị isi ojii ritere n'afọ a. Ụbọchị abụọ tupu Singh eturu ugo ya, Zozibini Tunzi nke Saụt Afịrịka tutere ugo dịka nwaanyị kacha mma n'ụwa n'asọmpi Miss Universe. Ụmụnwaanyị Igbo bụ 'olu gbajie boys' Ụmụnwaanyị Imo state bụ "a kwaa a kwụrụ" na Nigeria Na mba Amerịka, Cheslie Kryst bụ Miss USA, Kaliegh Garris bụ "Miss Teen USA" ebe Nia Franklin bị "Miss America". Ihe a bụ mbụ ndị isi ojii ji ọkwa ndị a n'otu oge. Ihe ntụrụ ugo ndị a jiri bụrụ ọpụrịche bu maka na ha mere n'ogige ebe anaghị ahụkarị ndị isi ojii dịka ndị eji ama atụ mma nwaanyị. Cheta na nwaafọ Naịjirịa Agbani Darego bụ onye isi ojii mbụ tụru ugo dịka "Miss World" nke o ritere n'afọ 2001. Ọ bụ Janelle Commissiong bụ onye isi ojii mbụ ritere ọkwa "Miss Universe" n'afọ 1977, dịka Vanessa Williams bụ onye isi ojii mbụ nwetere ọkwa Miss America n'afọ 1983. Carole Anne-Marie Gist bụ onye mbụ e nyere ọkwa Miss USA n'afọ 1990. Ibinabo Fiberesima bụ onye na-ahazị ntụrụ ugo "Miss Earth Nigeria" gwara BBC Igbo na ọ bụghị maka mma sọsọ ka ndị isi ojii jiri nọdụ n'ọkwa a ugbua. Ọ sị: "Ihe mere bụ na ndị mmadu aghọtala ihe ndị na-ahazi emume ọkacha mma nwaanyị na-achọ. "Ọzọ bụ na ụmụada a gbara ezigbote mbọ ịhụ na ha pụtara n'isi." Agbani Darego bụ onye agbụrụ ojii mbu tụrụ ugo dịka Miss World Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọbụghị eziokwu na ụfọdụ na-eche na ndi isi ojii amaghi mma. "Onye Naịjirịa gara emume Miss Earth pụtara n'ime ndị iri. Nke a bu mbụ Naijirịa ruru ọkwa a. O gosiri na ndị mmadụ na amụta etu esi asọ mpị a ọfụma." Ọkammụta May Ikeora gwara BBC Igbo na mmeri ndị a ga-enye ọtụtụ ụmụ nwaanyị isi ojii ikike ikwenye na mma ha, ọkachasị ugbua ndị mmadụ na-etinye ọnụ na oke agbụrụ Bekee kpọrọ "Colourism". Ọ sị: "Ihe a mere dị mma, mana ebe ọ na-emetụ m n'obi bụ ya bụrụkwa ihe ga-esi etu a gawa. "Ya abụkwana ọnọdụ ibinye aka, ka ọ bụru na a na-eme. Ya bụrụkwa nke ziri ezi." Ọ gakwara n'ihu kwuo na ihe a na-egosi nnabata n'ụzọ pụrụiche na agwa agbụrụ ojii na ntutu ha bu ihe mara mma. Fiberesima tinyekwara ọnụ n'agwa onye nọchitere anya Naịjirịa bụ Nyekachi Douglas kpara mgbe e thunyere Singh ugo "Miss World". Ọ sị na o gosiri obiọma ndi Naịjirịa. "Nwa ada nọchịtere anya Naịjirịa na Miss Universe bụ Olutosin Araromi kpakwara ụdịrị agwa a oge Zozibini Tunzi nke Sawụt Afịrịka nwetara mmeri. "Ihe a bu njirimara ndị Naịjirịa. Anyị na-enwe ọṅụ ma ndị mmadụ nwee mmeri."
[ "Ikike ụmụnwanyị", "Ekike", "Ụmụnyanyị", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50809107
Biko tọhapụnụ m ka m gaa ụlọọgwụ - Orji Uzor Kalu
Ụlọikpe tụrụ Orji Uzor Kalu mkpọrọ afọ iri na abụọ n'ihi na o riri ego ndị Abia Steeti oge ọ bụ gọvanọ.
2019-12-17T07:32:43Z
Orji Uzor Kalu: Biko tọhapụnụ ma ka m gaa ụlọọgwụ
Aka chiburu Abia Steeti bụ Orji Uzor Kalu ebeela akwa begara ụlọikpe dị na Legọs na-arịọ ka atọhapụ ya na mkpọrọ. Ọ bụ ọkaiwu Kalu rịọrọ ụlọikpe arịrịọ a n'ụbọchị Tuzde. Mkpọrọ afọ 12 a tụrụ Kalu gosiri na ịgbaba APC abụghị ịgbanarị ikpe - Rotimi Jacobs Orji Kalu amaala afọ n'ala n'ikwụsị nyocha ya. Kalu gwara ulọikpe na ahụ adịghị ya. O kwukwara na ọrịa ya abụghị nke ụlọọgwụ dị n'ụlọmkpọrọ ga agwọtali. Kalu rịọkwara ụlọikpe ahụ ka a tọhapụ ya n'ihi na ọ bụ onye omeiwu. O kwuru na onweghị onye ga-anọchite anya ndị mpaghara ya n'ụlọ omeiwu ukwu, bụ ebe o ji ọkwa 'chief whip'. Ọkaiwu EFCC bụ Ọkaiwu Rotimi Jacobs Mana ngalaba EFCC gwara ụlọikpe ka ha gbachi Kalu nkịtị. EFCC kwuru na ebe ọbụ na a tụọla Kalu mkpọrọ, onweghizi ike isi n'ụlọ mkpọrọ pụta ruo mgbe oge e nyere ya zuru. Ọka ikpe Mohammed Liman kwuru na ya ga-ekpebi ikpe ahụ n'abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Disemba. Onyeisiala Muhammadu Buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela aka na bọjeti 2020 ugbua, dịka o kwupụtara n'igwe Twitter ya. Agaghị m anabata nrụrụaka ntuliaka na 2023 Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'afọ 2023 ka ha gbasie mbọ ike n'ihi na ọ ga-aghị anagide nrụrụaka na ntuliaka. Ọ gwara ndị na-akwado iji ndị ọrụ nchekwa napụ ndị mmadụ vootu ha n'ike ka ha chee ya eche na ọ gaghị enwe ha ohere ahụ. Onyeisiala Buhari efebatala Naịjirịa Agbalịkwaranụ m- Buhari Buhari dọrọ aka na ntị a mgbe ọ na-anabata ndị ọrụ gọọmentị kpọtụrụ ya n'isiụlọọrụ n'emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya. O kwuru ka onye ọbụla ejila aha ya achụnta vootu na ntuliaka afọ 2023, ka onye ọbụla rụọ ọrụ dịrị ya. O metara buru Pope Francis gbara afọ iri asatọ na atọ n'ụbọchị Tuzde Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis ewepula iwu na-egbochi ịgba ndị ụkọchukwu e boro ebubo ịmetọ ụmụaka n'anwụ Nke a na-abịa dịka Pope Francis gbara afọ iri asatọ na atọ n'ụbọchị Tuzde. 'Gbagharanụ arụ na-eme n'ụlọ ụka' - Pope Francis Pope Francis a ga-ekwe ka ndị 'Fada' bido lụwa nwaanyị? O kwuru na ụkọchukwu ọbụla e boro ebubo ịmetọ ụmụaka ga-eji isi ya buru. Ọtụtụ ndị ụkọchukwu Katọlik ka a na-ebo ebubo ịmetọ ụmụntakịrị. Mana ọtụtụ n'ime ebubo a anaghị apụta ihe. Mikel Arteta ọ ga-aga Arsenal? Mikel Arteta nọ Manchester City ugbua Otu egwu bọọlụ Arsenal na-atule ịhọrọ Mikel Arteta ka ọ bụrụ onye nkuzi ha. Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ n'oge gara aga. Ugbua, ọ nọ na Manchester City ebe ọ bụ osote onye nkuzi. Carlo Ancelotti bụ onye nkuzi bọọlụ nwere nnukwu agba n'ụwa N'otu aka ahụ, ndị Everton na-atulekwa ịkpọta Carlo Ancelotti ka ọ bịa kuziwere ha. Ancelotti akụzierela otu bọọlụ dị icheiche n'akụkụ ụwa niile. Ha gụnyere Chelsea, Real Madrid, Juventus, AC Milan, Paris St Germain, Bayern Munich na Napoli. Otu RevolutionNow emeela ngagharịiwe na Legọs Ndị otu kpọrọ onwe ha RevolutionNow eburula ngagharịiwe gaa na 'Computer Village' dị na Legọs maka onyeisi ha bụ Omoyele Sowore nọ n'aka ndị DSS. Otu na-akpọkwa oku sị ka a kagbuo iwu megidere soshal midia nke ndị ụlọomeiwu chọrọ iwepụta nakwa ihe ndị ọzọ. A maala Perez Musharraf ikpe ọnwụ Ọchị agha Pervez Musharraf chiri Pakistan site n'afọ 2001 - 2013 N'ofesi, amaala onye bụbu onyeisi obodo ala mba Pakistan bụ General Perez Musharraf ikpe ọnwụ. A mara ya ikpe ọnwụ site na-ebubo eboro ya maka ịgba gọọmenti nke ọ nọ bụ n'isi ya site n'afọ 2001 ruo 2008 mgba okpuru. A malitere ikpe ya n'afọ 2013. Liverpool na Aston Villa ga-ezute na mgbeda a N'egwuregwu kee nkwụcha chebiri asọmpi Liverpool na Aston Villa mgbe ọ fọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asatọ nke abalịa. Onye nkuzi ndị ntorobia Liverpool bụ Neil Critchley sị na ya dị njikere izute Aston Villa ma nweekwa obi isiike ịgbapụ ya mkpụrụ ọkwụru n'anya na agba nke anọ nke iko Carabao. Naira Marley ọ banyela n'ofe ọkụ ọzọ? Otiegwu Naira Marley edepụtala n'akara twitter maka akụkọ o kwuru na-efegharị boro ya ebubo ohi ụgbọala. O dere na ọ bụ ndị afọ ọjọ na-ebugharị akụkọ na-ekwu na o zuru ụgbọala. Marley kwuru na agbanyeghị etu ụfọdụ ndị mmadụ si akatọ aha ya, na ya ga-abụrịrị onyeisiala Naịjirịa. Akụkọ ahụ na-efegharịnụ kwuru na otu ụlọikpe enyela iwu ka a nwụchie Naira Marley maka ebubo ohi ụgbọala. Cheta na o nwere mgbe ụlọọrụ 'Economic and Financial Crimes Commission' nwuchiri Marley maka ebubo mrụrụaka. Buhari etinyele aka na Bọjet 2020 Onyeisiala bụ Muhammadụ Buharị ga-ebinye aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu akụ nke afọ 2020 dịka ọ na eme emume ụbọchi ncheta ọmụmu ya taa. Ọ bụ n'ụbochị ise nke Disemba ka ndị ụlọ omeiwu nyere ikike ma kwenye na atụmatụ gọọmentị ga eji mefuo puku ijeri iri na ọma. Ụlọomeiwu ejirila N500bn bulite bọjeti 2019 BUDGET: Etu o siri dị na steeti dị n'ala Igbo Akụkọ kachasị n'abalị a: Naịjirịa nọ n'ụzọ agbaruola ihu maka ego e bere na bọjet Ndigbo N'otu aka ahụ ka ndị ụlọomeiwu wepụtara puku ijeri naira anọ na ọma asatọ maka ikwu ụgwọ Naijirịa ji, wepụta puku ijeri naira abụo na ọma anọ ma tinye ijer naira atọ n'ego mmefu ndị ụlọomeiwu nke mere ka ego mmefu ha pụta otu nari ijeri naira na iri abụo na asatọ. Onyeisiala bụ Muhammadụ Buharị ga-ebinye aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu akụ nke afọ 2020 dịka ọ na eme emume ụbọchi ncheta ọmụmu ya taa. Ọ bụ n'ụbochị ise nke Disemba ka ndị ụlọ omeiwu nyere ikike ma kwenye na atụmatụ gọọmentị ga eji mefuo puku ijeri iri na ọma. N'otu aka ahụ ka ndị ụlọomeiwu wepụtara puku ijeri naira anọ na ọma asatọ maka ikwu ụgwọ Naijirịa ji, wepụta puku ijeri naira abụo na ọma anọ ma tinye ijer naira atọ n'ego mmefu ndị ụlọomeiwu nke mere ka ego mmefu ha pụta otu nari ijeri naira na iri abụo na asatọ. APC agbagharala Okorocha na Okechukwu Otu ndorondoro ọchịchị APC sị na ya agbagharala ndị niile ha machipuru maka ekweghiekwe ha. Ndị a gụnyere Rochas Okorocha, Rotimi Akeredolu, Osita Okechukwu na ndị ọzọ. N'akwụkwọ odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Lanre Issa-Onilu dere, APC sị ndị a ha gaa mee udo na steeti ha dị iche iche ma soro ibe ha n'ọrụ mempe obodo Boeing ga-akwụsịlata ịrụpụta 737 Max Ozi anyị nụrụ na-ekwu na ụlọọrụ Boeing ga-emechinata ọrụrụ ụgbọelu ha bụ 737 Max na January. Boeing kachiri ntị ịrụpụta ya bụ ụgbọelụ agbanyeghị na ọ kụjara ụgboro abụọ gbuo ọtụtụ mmadụ Indonesia na Ethiopia. Ọ dịka uche Mikel Arteta adị n'Arsenal? N'egwuregwu, maka ọnyụpa Arsenal na-agba, ọ dịka ya bụ otu egwubọọlụ amalitela ịrọ Mikel Arteta nke Manchester City anya dịka onye nchịkota ha. Amabeghị ka Arsenal enyela Arteta ya bụ ọrụ ịnọchị Unai Emery bụ nke achụrụ n'ọrụ n'ọnwa Nọvemba mana Pep Guardiola sị na ya agaghị abụ ọgbatauhie ya ha. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Lee ihe nkiri anyị Akụkọ ga-amasị gị Ụwa ekwerela na ụmụnwaanyị isi ojii bụ dachịị? Ihe mere ụmụnwaanyị Ebonyi ji gbara ọtọ mee ngagharịiwe Ipob a ga-arịọ Rotimi Amaechi mgbaghara ugbua?
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50809108
'Onweghi N1.3bn gọọmentị Anambra ji rụọ ọkụ ekeresimesi'
Gọọmentị Anambra ekwupụtala okwu maka ebubo na ha kewapụtara N1.35B maka imezi obodo maka Ekeresimesi.
2019-12-17T17:36:55Z
Anambra Christmas Decoartion: 'Ọ bụghị gọọmentị na-emezi Anambara maka ekeresimesi'
Gọvanọ Anambra Steeti Gọọmentị Anambra Steeti akọwaala ihe gbasara ebubo oke mmefu ego ndị mmadụ na-ebo gọvanọ Willie Obiano. Otu a kpọrọ 'Human Rights Liberty Access and Peace Defenders Foundation' (HURIDE) kwuru na Obiano wepụtara ihe karịrị otu ijeri naira iji chọọ Anambara Steeti mma maka ekeresimesi. Onyeisi otu ahụ bụ Dede Uzor kwukwara na ego ahụ karịrị ego gọọmentị ji arụ ọrụ mmepe ndị ọzọ na steeti ahụ. Gọọmentị Anambra state ga-emefu N137.1b na bọjeetị afọ 2020 Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti Mgbe BBC kpọtụụrụ Uzor, ọ kọwara na ọ bụ na Soshal Midịa ka ha nwetere ya bụ akụkọ. Ọ kọwakwara na gọọmentị ekweghị akọwara ha nke ọma mgbe ha jụrụ ese maka ebubo ahụ. Ihe gọọmentị Anambra steeti kwuru Don Adinuba Mana Don Adinuba bụ Kọmishọna mgbasa ozi n'Anambra kwuru na ebubo ahụ niile bụ asị ọcha. Adinuba jụrụ sị: "Ego ole ka Anamabra steeti na enweta n'ọnwa ha ga-eji mefuo otu ijeri naịra na ụma maka ndozi ekeresimesi?" Ndị otu m gbara ụlọomeiwu Anambra steeti okirikiri - Uweojii Aka Willie Obiano adịghị n'ịhọpụta Eze ọhụrụ Aguleri Adinuba kọwara na Anambra steeti na agba mbọ ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa, na gọọmentị enweghị ego ha na-emefu emefu. O kwuru na ọbụ ụloorụ dị iche iche na enye aka imezigasị ebe ụfọdụ na steeti ahụ maka ekeresimesi. Kọmishọna ahụ kwukwara na ọbụ aka chịburu steeti ahụ bụ Peter Obi na-agbasa asịrị na Obiano na-emefu ego n'ụzọ ekwesịghị ekwesị. O kwuru na ọbụ Val Obi bụ onye enyemaka Peter Obi depụtara ya bụ akụkọ ụgha. Ihe Val Obi kwụrụ Peter Obi bụ aka chịburu Anambra Steeti Mgbe BBC kpọrọ Val Obi, o kwuru na aka ya adịghị n'akụkọ ahụ. N'okwu ya: "Onye sị na onwere ihe m dere, onye ahu wepụta ya." Obi kwuru na onweghị etu mmefu ego goomentị si gbasata ya. Akụkọ ga-amasị gị Ahmed Lawan akọwala ihe ndị ụlọomeiwu ga-eji kwado ego mgbazite mba ofesi Ọ bụ eziokwu na a chuturu igwe ndị Ekwulobia? Ihe mere ụmụnwaanyị Ebonyi ji gbara ọtọ mee ngagharịiwe Uru na ọghọm dị na ndị Afrịka ọzọ ịgba aka 'Visa' bata Naijiria Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50833179
APC akwala arịrị n'ọnwụ Sịnetọ Uwajumogu
Pati All Progressive Congress ebela akwa n'ọnwụ onye otuha bụ Benjamin Uwajmogu na-anọchiteanya Imo North n'ụlọomeiwu.
2019-12-18T14:17:49Z
Benjamin Uwajumogu alaala mmụọ
Benjamin Uwajumogu All Progressive Congress akwala arịrị maka ọnwụ Sịnetọ Benjamin Uwajimogu bụ onye otu ha na-anọchiteanya Imo North n'ụlọomeiwu. N'ozi ha depụtara n'akara twitter kwuru na Uwajumogu bụ onye umeala maara nke ekwe na-akụ na ndọrọdọrọ ọchịchị. Sịnetọ Benjamin Uwajumogu anwụrụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Wednezde 18 Disemba, afọ 2019. Onye bụbụ Kaụnselọ na-anọchiteanya Ideato North bụ George Ukeh gwara BBC Igbo na nke a bụ eziokwu. Obi na-agbawa ndị otiegwu maka ọnwụ DJ Arafat Omeiwu Independence Ogunewe anwụọla Ka ị ga-esi gbanahụ "ọdịda n'ike" na-ebute ọnwụ Ukeh sị na o nwetere akụkọ ọnwụ ya n'ọgbakọ 'Whatsapp' nke ndị pati APC Imo steeti n'ụtụtụ taa. Onyeisioche pati APC n'Imo Steeti bụ Dan Nwafor sị na ọnwụ ya bụ ihe ijuanya nakwa oke ụsụ nye APC, Imo steeti nakwa Naịjirịa. Ruo oge ọnwụ ya, Uwajumogu bụ onyeisioche kọmitii na-ahụ maka ndị ọrụ bekee, iwe ndị mmadụ n'ọrụ nakwa ịrụpụta ihe. Ihe e ji echeta ya bụ na ọ chepụtara iwu ga-ekpuchi ndị na-agba mpụ na nrụrụaka n'anwụ a kpọrọ 'Whistleblower and Witness Protection Bill'. Anyị ka na-agba mbọ ichọpụta ihe gburu ya bụ nke anyị ga-ewete n'uju. Ihe i kwesịrị ịma maka Benjamin Uwajumogu A mụrụ ya n'obodo Umuihi dị n'okpuruọchịchị Ihitte/Uboma nke mpaghara Okigwe, Imo Steeti. Ọ gụrụ akwụkwọ n'Uboma Sekọndịrị dị n'Ikperejere Etiti, gụọkwa na Mahadum New Jersey dị n'Amerịka, Madadum De Sorbonne nakwa Mahadum Schiller dị na Paris, Fransị. Ọ lụrụ nwaada Elleen Uwajumogu, ha mụrụ ụmụ atọ Ọ bụ onyeisioche mbụ ndị 'Social Democratic Party' n'Ihitte/Uboma n'afọ 1990, mgbe ọ dị naanị afọ 25. Ọ bụbụ onyeisioche ụlọomeiwu Imo Steeti n'afọ 2011 ruo afọ 2015. Ọ bụ Sịnetọ na-anọchiteanya Imo North n'ụlọomeiwu ukwu n'aha pati All Progressive Congress (APC). O nwetere ụfọdụ nturuugo site n'aka 'Chamber of Commerce' Abia Steeti, 'Rotary Club' nke Enugwu na ndị ọzọ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndị dara ọrịa mgbe akpụpụrụ ha n'ụlọikpe maka nrụrụaka Abaribe akpọọla oku ka enyocha usoro Visa Free Arrival ọfụma
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/50844515
Etu ọnụahịa ji rịa elu kamgbe Ọktoba 2019
Ndị ụlọọrụ National Bureau of Statistics agbaala afa ọnụahịa n'Ekeresimesi a.
2019-12-18T19:55:25Z
Nigeria Inflation: Ọnụahịa ejirila pasenti abụọ ria elu kamgbe Ọktoba 2019 - NBS
ahịa osikapa na nrị mkpụrụ ibe ya Gọọmentị site n'aka ndị National Bureau of Statistics (NBS) kwetere n'ezie na ọnụahịa ji ihe dịka pasenti iri na otu na ụma (11.85%) rịa elu. Nke a pụtara na ọnụahịa ejirila ihe ruru pasenti 0.24 ria elu kamgbe ọnwa ọktoba afọ 2019. Etu e si nweta aha ahịa anọ dị n'ala Igbo Ọnụ ahịa ihe a na-ere n'ahịa adaala n'ezie? Ndị ọrụ a kwuru nke a n'akwụkwọ ha kpọrọ 'ITS Consumer Price Index (CPI) and Inflation' nke ha wepụtara n'ọnwa Nọvemba 2019. Dịka Ekeresimesi na-atụnye ụkwụ ihe oriri ụfọdụ arịala ọnụ ebe ụfọdụ dara ada. Ebe gọọmenti na ndị ọrụ ugbo na aṅụrị n'ọnụahịa osikapa rịrị ọnụ ugbua maka okeala Naịjirịa e mechiri, ndị na-azụ azụ na-eti mkpụ na ọnụahịa nrị dị oke ọnụ. Nke a mere BBC Igbo ji gbawa ndị mgbere osikapa ajụjụ ọnụ ịmata ka ihe siri kwuru n'ahịa osikapa, iji maa atụ. Toyin Lawal bụ onye na-ere ahịa nri n'Enugwu ji Igbo kọwa ihe ọ na-eri ha na-ere osikapa site kemgbe Jenuwarị. Toyin sị na Jenuwarị ruo na Maachị ha rere akpa osikapa puku naira iri (N10,000) nke gbara narịa iri ise n'otu iko. N'ọnwa Apreelu ruo Mee, ha rere otu akpa osikapa puku naịra iri na atọ ruo iri na anọ (N13,000 - N14,000) bụ nke gbara naịra iri isii maọbụ iri asaa n'otu iko. Ebe ahụ ka o si rigoo puku naịra iri na anọ na Seputemba. Mgbe ọnwa Nọvemba ruru, akpa osikapa ruru ọnụ puku naịra iri na isii. Ebe ahụ ka o si ruo ebe ọ nọ ugbua bụ puku naịra iri na asatọ kwa otu akpa. Nke a bụ ọnụahịa osikapa Naịjirịa, ebe nke ofesi nọ na puku naịra iri abụọ na anọ otu akpa (N24,000). Lee ihe nkiri a Akụkọ ga-amasị gị Ihe mere ụmụnwaanyị Ebonyi ji gbara ọtọ mee ngagharịiwe Victor Ezugwu, odogwu rụrụ ụgbọagha bụ Igbo bịa lelee 'Ụmụakwụkwọ FUTO tọrọ na Croatia ga-alọta mgbe n'adịghị anya' - Abike Dabiri
[ "I gosi ahịa", "Naijiria", "Nri", "Nchekwa nrị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50835635
Ihe atụmatụ 'Impeachment' Trump pụtara
Ndị Omeiwu obele nke America binyeree aka n'akwụkwọ iji kpebie na Donlad Trump metere ihe ekwesiri iji chụọ ya n'ọrụ.
2019-12-19T04:49:06Z
Donald Trump: Ihe atụmatụ 'Impeachment' Trump pụtara
Pelosi na akụru Trump aka Dịka ndị Ụlọomeiwu obele na mba Amerịka ebinyere aka n'akwụkwọ akpọrọ "Articles of Impeachment" na Bekee Onyeisiala Donald Trump si na onweghi ebe ya na-aga. Atụmatụ 'impeachment' a kwuru na Trump emetere ihe ekwesiri iji chụọ ha dịka onyeisiala mba Amerịka. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisiala Amerịka nke atọ ndị ụlọ omeiwu tinyere akwụkwọ ka achụpụ n'ọkwa. Usoro enwereike ji chụọ Trump n'ọrụ Trump agaala ije na ndagwuru ugwu olulu ọnwụ Mana, dịka o dere n'akara Twitter ya, Trump sị na ihe a ndị Ụlọomeiwu Nta mere ezighi ezi ma kwuo na ha ya ka kwụ chịm na-eche ikpe n'Ụlọomeiwu Ukwu. Ọ bụ Nancy Pelosi bụ Onyeisi Ụlọomeiwu nta gụpụtara atụmatụ "Article of Impeachment" a ọ sị bụ maka Trump iji ọkwa chọọ ọganyị ihu nke a etu ekwesighi ekweshi. Pelosi bụ onye kachasị nwee ọkwa n'ogige pati Democrat bụ ndị tinyere uchu n'atụmatụ a. Nancy Pelosi ka ọkụrụ kpọmiji maa Trump ikpe mpụ Pelosi kwuru sị "ọ bụ agwa na ezighị ezi onyeisiala kpara mere ka o dị mkpa na achụturu ya n'ọkwa". Ka emechara ntuliaka eji maa Trump ikpe, Pelosi dere n'aka Twitter ya na onweghi onye gafere ikpe ikpe. Dịka ọ dị ugbua, Trump ka bụkwa onyeisiala Amerịka. Ọ bụ ndị ụloomeiwu ukwu ka ekpe zị ikpe ya ụgbụa. Kedu ihe ndi na-akwado Trump na-ekwu Patị Trump kwụ ya chịm n'azụ. Nke pụtara na enweghị olileanya na ha ga-ama ya ikpe na Sineti oge akwụkwọ 'impeachment' a rutere ebe ahụ. Ọtụtụ ndị Omeiwu patị Republikan tinyekwara ọnụ ma katọọ atụmatụ ịma Trump ikpe. Gịni butere okwu ịchụpu Donald Trump Ihe na-ese okwu bụ ebubo na Onyeisiala Trump gwara onyeisiala mba Ukrane bụ Volodymyr Zelensky ka o nyochaa onye bụbụ osote onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden. Dịka Trump siri kwuo, Biden na nwa ya nwoke aha ya bụ Hunter Biden tinyere aka na nrụrụaka banyere ego mgbe nwa amadị ahu na-arụrụ otu ụlọọrụ na Ukarane ọrụ. Trump sị na Iran na-atụ 'asị ọcha' maka ndị CIA ha 'nwụchiri' Trump na Kim a ga-ekwe n'aka nke udo? Nke bụ eziokwu bụ na ndị Ukrane mere nyocha maka ebubo a ma sị na onweghi mpụ ha hụrụ. Nke bụ isi mmiri bụ na iwu Amerịka machiri onyeisiala mba ahụ ị sị ka mba ọzọ mere ya ihe ọma. Lee Usoro njem ichutu Donald Trump Akụkọ ga-amasị gị APC akwala arịrị n'ọnwụ Sịnetọ Uwajumogu Barcelona na Real Madrid kere onwe ha agbụ Etu ọnụahịa ji rịa elu kamgbe Ọktoba 2019 Ndị dara ọrịa mgbe akpụpụrụ ha n'ụlọikpe maka nrụrụaka
[ "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Donald Trump", "Amerika" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50849059
O nweghi ozu nwata a hụrụ n'ụlọụka a gbara ọkụ n'Akure - Ndị Uweojii
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ondo steeti gwara BBC na ọ bụghị eziokwu na a hụrụ ozu nwata n'ụlọ ụka Sotitobire dị n'Akure.
2019-12-19T07:22:18Z
Sotitobire Church: Etu akụkọ ụgha si bute igbu onye uweojii na ịgba ụlọụka ọkụ
Ụka Sotitobire Ndị mmadụ gbara ụlọ uka Sotitobire dị n'Akure ọkụ ụnyaahu maka akụkọ ndị uweojii si bụ asị na-efere na soshal midia. Okwu a malitere n'ọnwa gara aga mgbe amaritere chọwa nwatakịrị aha ya bụ Gold Kolawole furu na ụlọụka ahụ. Nne nwatakịri a bụ Modupe Kolawole kpọ ya ga ya bụ ụlọụka mgbe atọrọ ya. Ozubulu Church Massacre: Otu afọ agafeela A mabeghi ndị wakporo ụlọụka n'Aguleri - Uweojii Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ondo steeti bụ Femi Joseph gwara BBC na ọ bụ ndị iwe na-ewe gara na ya bụ ụlọụka were gbaa ya ọkụ n'ihi na akụkọ si na-abọpụtara ozu nwantakịrị ahụ n'ụka ahụ. Nne ya bụ Kolawole gwara onye ntaakụkọ BBC na-enwere aka enwe n'ihe gbasara ofufu nwa ya. Kolawole kwukwara na ndị ụlọụka ahụ enyeghi ndị uweojii enyemaka dịka ndị chọrọ ka achọta ya bu nwa. Ụka Anglican achụọla ụkọchukwu abụọ na-edina onwe ha Ugboro ise akụkọ ụgha kpọtụrụ n'Ala Igbo Kama onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ kwuru na ọhụghị ozu nwa ahụ n'ụlọụka ahụ. Ndị uweojii sitere na ọnu na-ekwuchitere ha bụ Femi Joseph kwuru na ọ bu akụkọ ụgha dughere ndị mmadụ iji chee na ọ bụ eziokwu na egwụpụtara ozu ya bu nwa. Joseph kọwara na igwe mmadu iwe na-ewe gburu otu onye uweojii ma sị kwa na ọ bụ ihe onyonyo ụlọmgbasa ozi wepụtara bụ ihe mere ka akụkọ ugha a gbasaa ka ọkụ n'oge ụgụrụ. O kwukwara na igwe mmadu a jiri okwute chụọ ndị uweojii ọsọ ụkwụ eruala ma mebie ụgbọala ha. #Beyondfakenews: Ndị ntaakụkọ nyochanụ akụkọ tupu ụnụ ewepụta ya-Buhari Akụkọ na onye ọrụ atụnyereghị Buhari achụọ m ya n'ọrụ bụ ụgha- Obiano Kama o kwuru na ọ bụghi eziokwu na ndị uweojii gburu onye obụla. Onyeuweojii Joseph gwara ndị mmadụ na ha ka na enyocha ya bụ ofufu nwatakịri a bụ Gold Kolawole. Dịka ọ dị ugbua, ogbaaghara ataala isi mmadụ abụụ nke bụ otu onye uweojii na onye nkịtị. Lee ihe ndi mmadụ na-ekwu maka ya Lee foto sị ebe ahụ pụta: Akụkọ ga-amasị gị 'Impeachment' apụtaghi na Trump ga-aritu n'ọkwa Ihe ga-eme ugbua n'okwu nchutu Trump APC akwala arịrị n'ọnwụ Sịnetọ Uwajumogu Etu ọnụahịa ji rịa elu kamgbe Ọktoba 2019
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Ondo steeti", "Ozi asị", "Ofụfe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50835637
Ihe dị iche na bọjeti Naịjirịa nke 2019 na nke 2020
Etu bọjeti afọ 2019 na nke 2020 sị kwụrụ nakwa etu ọ ga-esi metụta akụnaụba Naịjirịa.
2019-12-19T14:18:23Z
2020 Budget: Etu o kwụ n'ihu nke 2019 nakwa etu ọ ga-esi metuta akụnaụba Naịjirịa
Onyeisiala Muhammadu Buhari Dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari tinyere akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2020 n'iwu, otutu ihe dị iche ebutela nrụrịtaụka banyere ya. Okwu a kpụ n'ọnu bụ ihe gbasara ihe ndị dịka Agụmakwụkwo, nchekwa, ahụike, ịko ubi na ihe ndị ọzọ. Ihedioha eweputala Bojet 2020 nke steeti Imo Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ gbasara budget 2020 Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere akụnaụba bụ Davoe Okorie kọwara BBC ụfọdu ihe maka Bọjetị 2020. Lee ihe na-egosi etu Bojetị 2019 na nke 2020 sị kwụrụ Okorie kọwara na ọ bụru na ego gọomentị wepụtara maka agụmaakwụkwọ, ahụike, nchekwa na ọrụ ugbo dị obere karịa nke afọ 2019, kedụ zie ihe mere Bọjetị 2020 ji karịa nke 2019? Budget 2019: Buhari etinyela aka n'akwụkwọ Gọọmentị Anambra state ga-emefu N137.1b na bọjeetị afọ 2020 Ọ kọwara na ọ bụ ụgwọ gọọmentị Naịjirịa chọrọ ikwughachi mere ka ego 2020 ji karịa nke 2019. Okorie gosikwara na Gọọmentị tụrụ anya na ha ga-akpata ego ga-eru puku nde naịra asatọ dịka ha dere na Bọjetị 2018 kama ọ bụ naanị puku ijeri naịra abụọ ka gọọmentị Naịjirịa kpatara. Ihe ị kwesiri ịma maka 'constituency projects' Etu ọnụahịa ji rịa elu kamgbe Ọktoba 2019 Ọ gara n'ihu kọwaa na gọọmentị na-ebite ego iji kwụọ ụgwọ ọnwa na ihe ndị ọzo na-agaghị amịta mkpụrụ a ga-eji kwụghachị ụgwọ. Ihe ọzọ o kwukwara bụ na ụgwọ "subsidy" gọọmentị na-akwụ na-anapụ ndị Naịjirịa ohere iji nweta ihe dị iche iche ga-eme ka ndụ dị ha mfe. Kedụ Ihe gọomentị ga-eme ka ihe dị mma Maazị Okorie sị na gọọmentị ga-eme ụfọdụ ihe ndị a iji mee ka ihe dị mma. Gọọmentị wetulata aka n'ego ha na-etinye n'ego enyemaka (subsidy). Ka gọọmentị belata etu ha si emefu ego ha ji elekọta ndị n'ọchịchị, Okorie kwuru sị " Ị lee anya ego opeketampe na-esiri anyị ike ịkwu". Gọọmentị ga-ejisi ike tinye iwu "Petroluem Downstream Deregulation Bill" nke ga-eme ka ndị ụlọọrụ dị iche iche zụọ ahịa mmanụ agbịdị. Na nchịkọta, Okorie sị na gọọmentị jisie ike tinye ego na akụnaụba Naịjirịa nke ga-eme ka ọrụ dị mma, were nwaayọ na-emefu ego ka Naịjịrịa nwee ike ikwụ ụgwọ ha ji. Akụkọ ga-amasị gị Ndị Omeiwu Nigeria amalitela ikwanyere Uwajumogu ugwu O nweghi ozu nwata a hụrụ n'ụlọụka agbara ọkụ n'Akure - Ndị Uweojii 'Impeachment' apụtaghi na Trump ga-aritu n'ọkwa APC akwala arịrị n'ọnwụ Sịnetọ Uwajumogu
[ "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Ọrụ ugbo", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-50858649
Usoro mmepe ala Igbo amalitela
Ndi isi ọchịchị ala Igbo ewepụtala usoro mmepe ọwụma anyanwụ n'ọgbakọ ha kpọrọ 'South East Economic Summit.'
2019-12-19T17:44:27Z
South East in Nigeria: Usoro mmepe ala Igbo amalitela
Ọgbakọ 'South East economic Summit' Ndị Gọvanọ South East na ndị otu na-ahụ maka mmepe obodo bụ SEREDEC ekwekọrịtala na ijikọ aka ọnụ na-akwadọ ọrụ bụ nke ga-eweta ọganihu na mmepe obodo. Onye isi ndị Gọvanọ ala Igbo bụ Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti gụpụtara ọtụtụ ọ natara chi dị na steeti ya dịka nnu Uburu, Osikapa Adani nke chọrọ nkwalite maka ọganịhu. Umahi: Ihe mere anyị agaghị ọsọ achụmnta vootu PDP Anyị amaghị ebe Uche Ekwunife kwụ ugbua - PDP Onye kpọkọtara ọgbakọ "Economic Forum" ma bụrụkwa onyeisi SEREDEC bụ ọkankuzi Bartholomew Nnaji kọwara na ebumnobi ha bụ ka ọ dị mfe mmadụ ma ọ bụ gọọmenti itinye ego n'ọrụ. Nnaji na ndị otu ya edepụtala ngalaba gụnyere 'Enyimba Industrial City', 'S/E gas pipeline', 'S/E finance Company SEFCO' dịka ebe gọọmenti na ndị nkịtị ga-etinye ego mmepe na mpaghaara ọwụwanyanwụ Naịjiria. Ọkammụta Barth Nnaji bụ onyeisi SEREDEC Ya bụ mmemme nkparịta ụka emere n'Enugu bụ nke gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ niile na ndị ọnụ na-erụ n'okwu maka mmepe obodo nọ na-ya. Dọkịta Pascal Dozie bụ onyeisi kọmitii Pascal Dozie bụ onye isi kọmitii mbụ kwuru na oge eruola mgbe ndị ọwụwaanyanwụ ga ewepụ "nkem nkem " ma tinye "nke anyị nke anyị" ka ọganịhu wee bịa. Akụkọ ga-amasị gị Ihe atụmatụ 'Impeachment' Trump pụtara O nweghi ozu nwata a hụrụ n'ụlọụka a gbara ọkụ n'Akure - Ndị Uweojii APC akwala arịrị n'ọnwụ Sịnetọ Uwajumogu
[ "Abia Steeti", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Anambra Steeti", "Ebonyi Steeti", "Akụ na ụba", "Imo steeti", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50863729
Mikel Arteta ọ bụ onye nzọpụta ndị Arsenal?
Mikel Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ tupu ọ laa ezumike nka.
2019-12-20T09:30:45Z
Mikel Arteta: Anyị chere na ọbịbịa Mikel ga-ewetarala Arsenal ihe ọma
Mikel Arteta Mikel Arteta Kelechi Anyikude amaama ka onye Igbo bi Ingland na-akwado Asernal sị na ọbịbịa Mikel Arteta bụrụ Arsenal ihe ọma maka ihe ọhụrụ ọ ga-ewetere Arsenal. Mikel Arteta abụrụla onye nkuzi ndị otu egwu bọọlụ Arsenal taa bụ Fraidee, abalị iri abụọ nke ọnwa Disemba afọ a. Ọtụtụ na-ekwu na Arteta nwere ike ịbụ onye nzọpụta Arsenal na-atụ anya ya. Arsenal achụọla Emery ọsọ mgbada Ihe ị kwesiri ịma maka Unai Emery Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ tupu ọ laa ezumike nka. Ọ ga-esonye na nzọụkwụ Ole Gunnar Solksjaer na Frank Lampard bụ ndị gbabuuru Manchester United na Chelsea bọọlụ ma bụrụzie ndị nkuzi ha ugbua. Mana nke a abụghị naanị ihe gbara ọkpụrụkpụ maka nwa amadị a. Ihe iri dịmkpa gbasara Mikel Arteta Mikel Arteta ga-anọchị anya Unai Emery bụ onye Arsenal chụrụ achụ Arteta bụ ezigbo enyi Xabi Alonso. Ha abụọ malitere ịgba bọọlụ n'otu mgbe n'otu egwuregwu bọọlụ a kpọrọ Antiguoko Mgbe ọ gbara afọ iri na ise Arteta bara Barcelona ebe ọ gbaara otu 'C' na 'B' ha bido na 1999 ruo 2002 O mechara gaa mba Fransị sonyere otu PSG nwa mgbe nta, tupu ọ gawa otu egwu Rangers nke mba Skọtland David Moyes gotere Arteta ka o sonyere ndị Everton n'afọ 2005; ebe ahụ ka o si gaa Arsenal na 2011 Arteta gbaara ndị Everton na Arsenal bọọlụ na EPL ihe ruru ugboro narị abụọ na iri asato na anọ (284) ma nye goolu iri anọ na atọ (43) N'afọ bọọlụ 2005/06, Arteta kụpụrụ Cristiano Ronaldo wee turu ugo 'Sky Sports' na-enye onye kacha agba etiti n'asọmpi EPL N'Arsenal, Arteta buru iko FA abụọ na Efere 'Community Shield' abụọ Na-agbanyeghị ike niile ọ kpara, Arteta agbaghịrị ndị otu egwu bọọlụ obodo ya bụ Spen; naanị na ogoogo U-16, U-17, U-18 na U-21 ka ọ gbaara ha N'afọ 2016 ka Arteta malitere ọrụ dịka osote onye nkuzi ndị Manchester City n'okpuru Pep Guardiola Arteta na asụ asụsụ Spanish, Basque, Catalan na English. Ọ na-asụkwa ntakịrị French, Italian na Portugese Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Usoro mmepe ala Igbo amalitela Lee ka 'Head Bridge Onitsha' ga-adị n'Ekeresimesi a Buhari, Ihedioha akwaala arịrị maka ọnwụ Benjamin Uwajumogu Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Egwuruegwu", "Bọọlụ", "Arsenal" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50866217
Lee ihe mere izuụka a ji bụrụ 'Sekem'
Ọ bụrụ na-ewere ihe niile mere n'izuụka a mee ihe ejiji, ọ ga-erete ezigbo ego.
2019-12-20T13:15:01Z
Naira Marley: Lee ihe mere izuụka a ji bụrụ Sekem
NairaMarley Sịte na ndọrọndọrọ ọchichi ma rụọ na ndị na-eti egwu, izuụka a kpụ ọkụ n'ọnụ. Ka anyị bido na ihe gbasara ụlọụka COZA na otiegwu Davido, Wizkid na Tiwa Savage. 1) COZA na ndị otiegwu Ihe so wụo ewu n'ịzu a bu akụkọ na-ekwu na ndị ụka COZA jị ụzọ aghụghọ tinye ndị otiegwu ama ama bụ Wizkid, Davido na Tiwa Savage n'ihe ejiji ha ji akwado emume ụka ha chọrọ ime. Mgbe ndị otiegwu a chọpụtara aghụghọ a, ha were iwe ma gosipụta ya na ihe ha depụtara na Soshal Midia ha . Lee ihe ejiji nke eji Davido mee. Lee ihe ejiji nke eji Wizkid na Tiwa Savage mee Lee etu ha si gosipụta iwe ha Tiwa Savage Wizkid Davido Ka ọ dị ugbu a, ndị COZA ewepụla ihe ejiji a ha mere, kama onweghị ihe ha kwurula maka ya. 2) Donald Trump Trump ka bụ kwa Onyeisiala Amerịka dịka ọ na-eche ka ndị ụlọomeiwu ukwu kpebie Ndị ụlọomeiwu nke mba Amerịka emeela atụmatụ 'impeachment' nke kwuru na Trump emetela ihe ekwesiri iji chụọ ya dịka onyeisiala mba Amerịka. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisiala Amerịka nke atọ ndị ụlọ omeiwu tinyere akwụkwọ ka achụpụ n'ọkwa. 3) Sotitobire Church Ndị mmadụ gbara ụlọ ụka Sotitobire dị n'Akure ọkụ maka akụkọ ndị uweojii sị bụ asị na-efegharị na soshal midia. Okwu a malitere n'ọnwa gara aga mgbe amaritere chọwa nwatakịrị aha ya bụ Gold Kolawole furu n'ụlọụka ahụ. O nweghi ozu nwata a hụrụ n'ụlọụka a gbara ọkụ n'Akure - Ndị Uweojii A mabeghi ndị wakporo ụlọụka n'Aguleri - Uweojii Dịka ọ dị ugbua, ogbaaghara ataala isi mmadụ abụọ nke bụ otu onye uweojii na onye nkịtị. 4) Emume ncheta ọmụmu onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buhari Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buhari mere ncheta ọmụmụ ya n'ụbọchi 17 nke ọnwa Disemba a. Ozi nwunye ya bụ Aisha Buhari dere na Twitter butere ọtụtụ akụkọ. 5) Kamaru Usman Kamaru Usman bụ nwaafọ Naijirịa ma bụkwa onye ama ama n'egwuregwu 'MMA' meriri mgba ma ka bụrụkwa okaibe ji mgba n'ụkwụ nke ndị UFC. 6) 6years single Term : Atụmatụ onyeisiala iji afọ isii chia otu mgbe. Ndị ụloomeiwu nta ewepụla atụmatu ime ka onyeisiala iji afọ isii chia otu mgbe. Otutu ha kagburu ya ma sị na onweghị ihe mere etu ọ dị ugbụ a. 7) Onwụ Benjamin Uwajumogu Benjamin Uwajumogu bụ onye na-anọchite anya Imo North na ụlọ sineti Naịjirịa Benjamin Uwajumogu bụ onye na-anọchite anya Imo North na ụlọ sineti Naịjirịa nwụrụ n'ụbọchi nke asatọ n'ọnwa Disemba 2019. Ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naijirịa zitere ezinụlọ ya ozi itiakanobi. 8) Naira Marley Otiegwu ama ama bụ Naira Marley wuru n'izu a ọkachasi maka egwu ọhụrụ a na-agba nke ọ kpọrọ Tesumole. Ihe ọzọ mere ka nwaokoroobia ji pụrụ onye akpụ n'ọnụ bụ egwu ohụrụ otipụtakwara n'izuụka nke ọ kpọrọ 'LOL- Lordoflamba'. Akụkọ ga-amasị gị Buhari, Ihedioha akwaala arịrị maka ọnwụ Benjamin Uwajumogu Ihe iri ịkwesịrị ịma maka Mikel Arteta 'onye nzọpụta' ndị Arsenal na-abịanụ Ihe dị iche na bọjeti Naịjirịa nke 2019 na nke 2020
[ "Naijiria", "Ndị otu Kristi", "Abụ", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/50863730
'Ipob ebuteghị ọgbaaghara n'Oraifite' - Ifeanyi Ejiofor
Ndị uweojii kwuru na ha na-achọ Ifeanyi Ejiofor achọ n'ihi ọtụtụ ebubo e boro ya.
2019-12-20T15:39:55Z
'Ipob ebuteghị ọgbaaghara n'Oraifite' - Ifeanyi Ejiofor
Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor akọwala BBC Igbo akụkọ nke ya maka ọgbaaghara dapụtara n'obodo Oraifite, n'ụlọ ya bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu, n'izuuka atọ gara aga. Na mkparịtaụka Ejiofor, ọ gwara BBC n'ekwentị n'ụbọchị Fraide na ọ bụ Emeka Offor zitere ndị uweojii ka ha bịa gbuo ya. Ọkaiwu Nnamdi Kanu agbaala ndị uweojii akwụkwọ maka ịwakpọ ụlọ ya 'Anyị amaghị maka iwu sị ka a ghara inwuchi Ifeanyi Ejiofor' - Ndị Uweojii Ejiofor sị na o ji ihe akaebe gosiri n'ezie na Emeka Offor chọrọ iwepu ndụ ya, mana oge erubeghị mgbe ọ ga-agba ya n'anwụ. BBC Igbo kpọtụụrụ Ebuka Obi bụ onye enyemaka mgbasa ozi Emeka Ofor mana o kwuru na ihe niile Ejiofor kwuru bụ asị ọcha. Ndị uweojii na ndị a na-eche na ha bụ ndị otu 'Indigenous People of Biafra' takọrọ isi na be Ifeanyi Ejiofor n'abalị mbụ nke ọnwa Disemba. Ndị uweojii kwuru na ndị otu ha mmadụ abụọ nwụrụ na ọgbaaghara ahụ. Mana Ifeanyi Ejiofor kwuru na ndị uweojii gburu mmadụ anọ ebe ahụ. Ifeanyi Ejiofor O kwukwara na mgbọ tụrụ nne ya n'ụkwụ oge ọgbaaghara ahụ dara. Cheta na ndị uweojii ekwubuola na ọ bụ ndị mmadụ wetara mkpesa megide Ejiofor nke mere ha ji gaa be ya ịnwụchi ya n'ụbọchị ahụ. BBC kpọtụkwaara Haruna Mohammed, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii maka ebubo ọhụrụ a Ejiofor boro ha, o kwuru na ọkaiwu ahụ bụ asịrị ka ọ na-akụ. Maka ebubo na ya na ndị Ipob na-arụkọ, Ejiofor gọrọ na o nweghị ndị Ipob ha na ya na-arụ. Ọ sị na ndị nọ na be ya bụ ndị ọrụ na-arụrụ ya ụlọ. Ifeanyi Ejiofor na-ebo na ọ bụ ndị uweojii gbara ụlọ ya ọkụ, ma ndị uweojii na-agọ O bokwara ndị uweojii ebubo igbu mmadụ anọ na be ya, were buru mmadụ abụọ ha mataghị aha ha were pụọ. Mmadụ abụọ ndị nke ọzọ ha huru ozu ha n'ohia bụ Mathew Okoro naIzuchukwu Nwatu. O bokwara ndị uweojii ebubo ịgba ihe uru ụlọ obibi na ụlọahịa ruru iri abụọ oku n'ogbe ya. Ejiofor kwuru na ihe ya jiri lọta bụ maka akwamozu emere na be ha bụ nke emechererị mgbe ya bụ ọgụ dara n'ebe ọzọ. Ọ sị na ọ bụghị na be ya ka ndị Otueke na ndị ọzọ nụwara ọya bụ ọgụ. Ejiofor sị na o nweghị ihe jikọtara ya na ndị Otueke karịa na ọ bụ ya bụ ọkaiwu tinyere aha ha na akwụkwọ nke gọọmenti. Ifeanyi Ejiofor sị na ihe a bụ ụlọ ya ndị uweojii mebiri N'ọsịsa ndị uweojii nyere, ha sị "Ọ bụrụ na Ejiofor ma na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu, ya nyefee onwe ya n'aka ndị uweojii ka anyị wee mee nnyocha zuru oke. Ejiofor gwara anyị na ụlọikpe enyela iwu ka ndị uweojii ghara ịnwụchi ya ọzọ ruo mgbe ekpebiri ikpe. Mana Haruna kwuru na ndị uweojii enwetabeghi akwụkwọ dị otu a n'aka ụlọikpe ọbụla bụ nke Ejiofor gosiri BBC. Ihe Ifeanyị Ejiofor kwuru na ndị uweojii mebiri na be ya Gịnị na-esere Ifeanyi Ejiofor na Emeka Offor? Ejiofor kọwara na e nwere ọrụ ya na Emeka Offor rụkọrọ n'afọ 2006. O kwuru na ọ bụ ya na Mathew Igbokwe, lagoro mmụọ, so wee rụọrọ Emeka Offor ọrụ ahụ na mba Sao Tome. Mana mgbe a kwụrụ ụgwọ, Emeka Offor enyeghi ha oke nke ruru ha. Ihe Emeka Offor sara Ebuka Obi, onye enyemaka mgbasa ozi Emeka Offor ziteere BBC ozi. O kwuru na ihe niile Ejiofor kwuru bụ asị kpụ ọkụ n'ọnụ. N'okwu ya, "Gịnị kpatara na ọ bụ ugbua ndị uweojii na-achọ ya achọ ka Ejiofor na-ebo ebubo a?" "Gịnị mere na ọ gaghị kpesara ndị uweojii kamgbe?" "Emeka Offor bụ onye oji ego achụ ego a ma ama; ọ naghị etinye aka n'ihe ọbụla ezighi ezi n'iwu." "Ọkaiwu Ejiofor kwesịrị ịga zara ọnụ ya n'aka ndị uweojii ghara itinye aha Emeka Offor na ya." Akụkọ ga-amasị gị: Lee ihe mere izuụka a ji bụrụ 'Sekem' Buhari, Ihedioha akwaala arịrị maka ọnwụ Benjamin Uwajumogu Ihe iri ịkwesịrị ịma maka Mikel Arteta 'onye nzọpụta' ndị Arsenal na-abịanụ Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Nnamdi Kanu", "Anambra Steeti", "National security" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50857850
Aga m akwụ ndị ọrụ N30,000 malite n'ọnwa Jenụwari 2020 - Umahi
Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi ekwela ngwa ịkwụ ndị ọrụ puku naịra iri atọ dịka ụgwọ ọnwa opekatampe.
2019-12-21T11:32:02Z
Ebonyi Minimum Wage: 'Aga m akwụ ndị ọrụ N30,000 malite n'ọnwa Jenụwari 2020'
Gọv David Umahi Gọvanọ Dave Umahi sị na ọ ga-amalite n'ọnwa Jenụwarị afọ 2020 kwụwa ndị ọrụ Ebonyi steeti puku naịra iri atọ dịka ụgwọ ọnwa opekatampe. Onye ndụmọdụ ya na mgbasaozi bụ Francis Nwaeze mere ka BBC Igbo mata nke mgbe a kpọtụrụ ya n'ihe banyere okwu a. Ihe mere ụmụnwaanyị Ebonyi ji gbara ọtọ mee ngagharịiwe Ebonyi so kachasị daa ụbịam na Naịjirịa Nwaeze sị na ọdịla anya gọvanọ Umahi kwere nkwa sị na ọ bụrụ na gọọmentị etiti tinye ya n'iwu na ọ bụ ihe ọ ga na-akwụ ndị ọrụ. Ọ sị na gọvanọ hiwere kọmitii ga-elebanya n'usoro a ga-eji akwụ ụgwọ ọnwa opekatampe a. Na mkpebi a si na mpụtara ihe ndị kọmitii ahụ chọpụtara bụ nke gosiri na ha ga-akwụli ya. Nwaeze gara n'ihu kwuo na o nweghi onye ọbụla manyere gọvanọ Umahi ime mkpebi a n'ike, kama na ọ bụ nke o mere n'aka ya. Buhari na ndị ECOWAS Buhari gara ọgbakọ ndị Government of the Economic Community of West African States (ECOWAS) Onyeisiala Muhammadu Buhari akwaala arịrị kọwaa na mkpamkpa ndị omekataraihepụọụjọ n'ọdịda anyanwụ Africa bụ ihe kacha adọchị ọganihụ azụ. Ọ kwuru nke a n'ọgbakọ nke iri ise na isii nke ndị Economic Community of West African States (ECOWAS) mere n'Abuja ụbochị Satọde. Buharị kwara arịrị maka ndị agha ururu iri asaa ndị omekome a gburu na mba Nije. O kwusikwara ike na gọọm̀enti ya kwadosiri azụmahịa na mekọrịta nke mba ECOWAS. Ndị bịara ya bụ ọgbakọ bụ Onyeisi ọgbakọ ECOWAS bụ Jean-claude Kassi Brou, Onyeisiala mba Nji bụ Issoufou Mahamadou, Ndị ọzọ bụ ọnye bụbu onyeisiala Naịjriịa bụ akubu Gowon, onye nnọchite anya odeakwụkwọ United Nations bụ Mohamed Ibn Chambas na ndị ọzọ. Ọkụ na-agba ọzara n'Ọstralia N'ofesi, ndị ọrụ gbata gbata mba Australia adọọla ndị na-eme njem ụgbọala na mba ahụ ha kpachara anya ha maka oke ọkụ na agba ọzara nke ndị na mba ahụ. Ndị ọrụ ọkụ ruru puku iri nọ n' ọrụ ịgbanyụ ọkụ kariri narị nke oke ifufe na okpomọkụ ekweghị sị mata ebe ọkụ ọzọ ga ebido. Everton na Arsenal N'egwuregwu, n'asọmpị Premier League agbara n'ihihie, Everton and Arsenal achịtaghị aja ma ọlị. Taa ka ndị nọchitere anya ndị nkuzi ndị Arsenal bụ Freddie Ljungberg na ogbo ya nke Everton bụ Duncan Ferguson ga-agagodi n'ụsọ. Carlo Ancelotti (akanri) na Bill Kenwright, onyeisioche ndí Everton ka ha na-enwe mkparíta úka Carlo Ancelotti ga-abụzị onyenkuzi ndị Everton mgbe ọzọ ha ga-asompi otu Mikel Arteta ga-esi nọchie oche ndị Arsenal mgbe ọzọ. Gee akụkọ ndị n'otu nkeji Amerịka eburula agha gaa n'agbata eluigwe na uwa The Space Force has been something of a pet project for President Trump Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ewepụtala ngalaba ndịagha ọhụrụ na-ebu agha n'agbata ihu eluigwe na ụwa a kpọrọ US Space Force. Na mgbape ngalaba a Trump sị na ihu eluigwe na ụwa bụzi ebe ọhụrụ a ga na-alụagha n'ụwa ugbua. FIFA awụọla Naịjirịa n'ala Ndị FIFA awụọla Naịjirịa n'ala dịka ha jụrụ inye Naịjirịa ikike ịhazi asọmpi Iko Mbaụwa nke ụmụnwaanyị nọ n'okpuru afọ iri abụọ afọ 2020 Ha nyere mba Mba Costa Rica na Panama ikike a kwuo na afọ ejughi ha n'ụdịrị akụrụngwa egwuregwu Naịjirịa nwere. Nkeji Ehihie Ụmụaka iri abụọ nwụrụ n'ibi ugwu Emume nwata ji abụru nwoke bụ ihe nzuzo Gọọmentị Saụt Afịrịka emechiela ọtụtụ ụlọakwụkwọ ebe a na-anọ a kwado ụmụaka maka emume iji tozuo ịbụ nwoke dịka ụfọdụ so n'emume ahụ nwụrụ. Ngalaba na-ahụ maka omenala na ofu sị na-emechiri ụlọakwụkwọ ndi dị n'ebe dị iche iche na mpaghara "Eastern Cape" ruo otu afọ. Ọ kpọkwala ka anwụchie ndị aka ha dị n'ọnwụ mmadu ruru iri abụọ. Emume eji anabata nwata n'etiti nwoke gụnyere ibi ugwu nakwa ibi n'ụgwụ ọtụtụ izu ụka. Ehe mere e ji ebi ugwu? Kwa-afọ, puku na puku mmadụ dị afọ iri na ise ruo iri na asaa na aba ọhịa ebe a na-akụziri ha etu ha ga-ejiri bụrụ nwoke ga-abara obodo uru. Mana, adịghị ekwu ihe na-eme ebe ahụ. Emume a a na-akpọ "Ukwaluka" bụ nke a na-ahụ dịka ihe dị mkpa nwata nwoke ga-agafe iji bụrụ nwoke kpọm kwem n'agbụrụ ndị kachasị buo ibu na Saụt Afịrịka nke gunyere Xhosa na Ndebele. N'ọtụtụ na eso emume a, mgbe ụmụaka na-alọta na-abụ ezigbote mmemme. Nlọta ndị agbụrụ Ndebele n'afọ 2013 Mana ụfọdụ oge oke ihe na-eme, dịka ọnwu ụfọdụ ụmụaka maọbụ nwete ezibote mmerụ ahụ site na ibi ugwu. Narị na narị ụmụaka nwoke gara ụlọ n̄ọgwụ n'afọ gara aga maka ibi ugwu agaghi ọfụma. ụfọdụ ebe a na-eme emume a enweghi ikike n'aka gọọmentị ime ya. Akwụla n'ụzọ aghara aghara - Onyeisi Uweojii Ndị uweojii na-ekwu na anaghị emeta ha nke ọma etu ekwesịrị Dịka njem ekeremsimesi ebirila ọkụ n'uju, onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu enyela iwu ka ndị uweojii ghara ịkwụchi ụzọ aghara aghara, kama ka ha kwụrụ naanị n'ebe ndị amawapụtara ha. ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Guardian nwere n'Abuja ụnyaahụ. Naịjirịa esorola mba na-akpagbu mmadụ n'ihi okpukperechi Gọọmentị Amerịka etinyela aha Naịjirịa n'ime mba ndị ha sị na-anabata mkpagbụ ndị mmadụ n'ihi okpukperechi ha. Naịjirịa na mba dịka Cuba, Nicaragua na Sudan esorola Comoros, Rọshịa na Uzbekistan bụ aha ha dị n'akwụkwọ a. Onye nchịkọta ọhụrụ nke Arsenal bụ Mikel Arteta sị na ọ dị njikere ọ tọpu ndị Arsenal n'agbụ ọnyụpa ha nọ na ya kamgbe. Arteta sị na ọ bụ oke nsọpụrụ o nwere n'ebe Arsenal nọ mere o jiri nabata ịbụ onye nchịkọta ha. Nkeji Ihe nkiri
[ "Naijiria", "Omenala", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "South Africa", "Arsenal" ]
https://www.bbc.com/igbo/50879629
Ljungberg ọ bụ ngwere dara n'elu jaa onwe ya ike?
Everton na Arsenal agbaghị aka ahịa.
2019-12-21T15:29:15Z
Everton vs Arsenal: Ljungberg emeela ike ya mana ozughị
Freddie Ljungberg Freddie Ljungberg ga-apụrụ Mikel Arteta n'oche taa Ihu atọghị ndị nkwado otu egwubọọlụ Arsenal na Everton ọchị taa ka otuegwu bọọlụ abụọ ahụ gbara ọnyụpa na Premie Lig ụbọchị Satọde. Agbanyeghị, ndị otu abụọ ahụ nụrụ ọgu ka agụowuru abụọ meruru ahụ ebe ọgụgụ sị na ndị Arsenal jidere bọọlụ ihe ruru 57% ebe Everton ji ya 43%. Mikel Arteta ọ bụ onye nzọpụta ndị Arsenal abịala? Onye ga-anọchị anya Arsene Wenger? Everton ewerela ajị imi Chelsea kpọrọ ụtaba Asọmpi a bụ nke mbụ nke ikpeazụ Freddie Ljungberg ga-eji nyere Mikel Arteta ohere dịka onyeis nkuzi ndị Arsenal. Otu ekwubọọla abụọ agbaghị aka ahịa site na mbido ya bụ egwuregwu ruo na ọgwụgwụ ya nke bụ na ụfọdụ che na ọ bụ ya bụ asọmpi kacha njọ kemgbe agbawara Premia Lig. Ihe atụrụ anya n'aka Mikel Arteta karịrị akarị ọkachasị ikpogote Arsenal n'ogogo Premia Lig bụ ebe ha na-agba ndị nke itoolu. Onye jigodi oche onyenkuzi ndị Everton bụ Duncan Ferguson na-aja onwe ha ike na-ekwu na ha mere ike ha ịhu na Arsenal emerighị ha n'ụlọ. Nke a bụ ugboro atọ emeribeghị ha n'asọmpi. Obi juru ya afọ maka ihe ndị otu ya gbara taa, agbanyeghị na ha emerighi, ebe ọ na-atụanya ịnabata onye ndụ ọhụrụ ha bụ Carlo Ancelotti echi. Egwuregwu a ka ndị na-anọchite anya ndị nkuzi otu abụọ a bụ Freddie Ljungberg na Duncan Ferguson ga-eji nyere ndi isi ha efe n'oche. Ndị nkuzi abụọ a nọkwanụ n'ụsọ ekiri ihe ndị otu ha mere n'ọgbọ bụ ebe ha ga-anọ mara ihe ha ga-eme iji mee ka ọnọdụ ha gbagote. Ọnweghị ndị nwere ibe ha goolu ka ya bụ asọmpi gwuchara. Akụkọ ga-amasị gị Barcelona na Real Madrid kere onwe ha agbụ 'PEPEsoup' oke ọnụahịa Arsenal agbaala ụka n'azụ ụlọ ha
[ "Egwuruegwu", "Premier League", "Arsenal" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50883663
Ọkụ gbara obi ndị ọrụoyibo n'Anambra
Ndị uweojii kọwara ka ọkụ sị gbaa obi ndị ọrụoyibo n'Amawbia, Awaka.
2019-12-22T11:58:20Z
Anambra steeti fire: Ọkụ gbara obi ndị ọrụoyibo
Ọkụ gbara obi ndị ọrụ n'Awka Ọkụ ọgbụgba Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ọkụ gbara n'ụlọọrụ gọọmentị dị n'Amawbia, Anambra steeti. Ya bụ ọkụ metutara ụlọọrụ onyeisi ndị ọrụ bekee akpọrọ Head of Service na Bekee nke steeti ahụ bụ ebe ndị uweojii na-ekwu na ha amabeghị ihe bidoro ya bụ ọkụ ruo ugbua. Akụkọ ndị ọkụ gbara ahia ha n'Onicha 'Tanka nsi bụ ihe menyụrụ ọkụ n'Onitsha' Ọkụ agbagbuola mmadụ atọ na Nnewi Onyeisi ndị uweojii bụ John Abang ehiwela kọmitti ka enyocha ihe bidoro ya bụ ọkụ. GIGM sị na ọnweghị ndị atọọrọ n'ụgbọla ha Ndị ọrụ Good is Good Motors ekwuola na-ọnweghị dị atọọrọ n'ụgbọala ha mere njem ụnyahụ bụ Satọde. Ha dere n'akara Twitter ha na ndị ọkwọụgbọala ha niile lọtachara n'udo na njem ha mere. Gọọmenti Naịjirịa sị na ha anaghị akpaoke okwukwe Ọzọ, gọọmenti Naịjirịa agọọla n'ebobo ahụ na-agụnye ha na mba na-enweghị nkwaugwu na nsọpụrụ nye okpukpere chi ndị mmadụ abụghị eziokwu. Mba Amerika gụnyere Naịjirịa na mba na-enweghị nkwanye ukwu na nsọpụrụ nye okpukpere chi bụ nke ọnụ na-ekwuru gọọmenti ahụ bụ Lai Muhammed sị na ọ bụ asị. Modi asaala aka agụgọ maka iwu na-eso okwu Onyeisi mba India Narendra Modi sị na ọ bụ ndị pati ndorondoro ọchịchị ọzọ na-akpụta okwu a N'ofesi, Onyeisiala India bụ Narendra Modi achiliela aka gọọ na iwu ahụ ha tiri abụghị maka imegide ndị okpukperechi Alakụba. Modi sị na ya bụ iwu bụ maka iji chekwaba ndị nọ na mkpagbu na mba ahụ. Ihe ruru mmadụ iri abụọ anwụọla na ngagharịiwe maka iwu a ha sị na ọ bụ mkpagbu nye ndị ụka Alakụba. Watford egbuo Man. U Paul Pogba dịla anị mgbe a gbaturu ya Ụnụ ahụlanụ na ndị kpee azụ ebuwela ụzọ taa na Premia Lig ebe Manchester United ghọrọ itibọrịbọ n'aka Watford n'asọmpị ha taa na. Watford ji ọkpụ abụọ asataghị ihe merie Manchester United ebe Chelsea jikwa ọkpụ abụọ asataghị ihe ọbụla nyụọ Tottenham Hotspur anya. Gee akụkọ ndị na otu nkeji Ndị uweojii Abuja akatọọla ogbugbu onye otu ha ji ọkwa 'Inspector' gbagburu ibe ya ji ọkwa 'Corporal' ma gbuokwa onwe ya. Onye ASP ndị uweojii bụ Mariam Yusuf sị na nke a mere n'ubọchị Satọde n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na Dutse Alhaji dị n'Abuja. Onye uweojii egbuola onye agha na Port Harcourt Ndị uweojii egbuola Augustine Agulegbu Ọ sị na 'inspector' ahụ gbara onye 'corporal' egbe merụọ osote 'superintendent' ahụ tupu o gbuo onwe ya. Yusuf sị na kọmishọna ndị uweojii bụ Bala Ciroma enyela iwu ka e mee ezigbo nyocha banyere nke a. Ọ sịrị na ndị uweojii na-eti ezinaụlọ ndị a nwụrụ anwụ aka n'obi. Gọọmenti etiti ekwela nkwa na ọkụ latrik ga-abụ sara na mbido, n'etiti nakwa ngwụcha oge ekeresimesi a. Minista na-ahụ maka ọkụ latrik bụ Goddy Jedy-Agba kwuru nke a oge enyocha ngwa ọkụ latrik Azura dị n'obodo Ihovbor nke Edo steeti. Gọọmentị na ndị Discos na-ama aka onye mere Naịjirịa ejighi nwee ọkụ 'Itinye ego mgbazite n'ọkụ latrikị abụghị ihe kacha mkpa ugbua' - Sam Amadi Jedy-Agba kwuru na ọkụ latrik a na-ewepụta ugbua karịrị ka ọ dị na mbụ. Ọ sị na ndị ọrụ na-ewepụta ọkụ nakwa ndị na-ekesa ọkụ nakwa gọọmentị na-arụkọ ọnụ iji mezuo nkwa a. Jedy-Agba dọkwara aka na ntị megide ndị mmadụ izu maọbụ imebi akụrụngwa ọkụ latrik n'ụzọ ọbụla. N'ofesi Onyeisiala mba Fransi bụ Emmanuel Macron arịọla otu jikọtara ndị ọrụ ụgbọala arịrịọ ka ha kwụsị abụbụ ọrụ ha gbara nke ga-emegide njem n'oge ekeresimesi a. Ọ sị ka ndị ọrụ biko jiri maka nsọpụrụ ha nwere n'ebe ezinaụlọ ha nọ mee udo. N'egwuregwu Manchester United na Watford ga-adọbiri ya n'asompi Premier League mgbe Watford ga-ele ha ọbịa. A na-atụanya na Paul Pogba ga-eso gbaa asọmpi a dịka ọ nọchara ọnwa anọ na-agbaghị bọọlụ n'ihi mmerụ ahụ. Nkeji Ihe nkiri Onyeisiala Buhari etiela mkpu maka agụmaakwụkwọ Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị nkuzi Mahadum ka ha gbalịa na-azụ ụmụakwụkwọ nke ọma ka ha nwee ike baa uru n'ebe ha na-arụ ọrụ. O kpọrọ oku a n'emume mpụta na mahadum Tekịnụzụ dị n'Akure ebe osote odeakụkwọ otu jikọtara Mahadum bụ Suleiman Ramon-Yusuf nọchiri anya ya. Anyị ụwa niile dị na mahadum anyị - Unilag Onyeisi mahadum Lagos bụ Ọkammụta Oluwatoyin Ogundipe sị na mahadum ahụ aghaghị agba nkịtị n'okwu ndị nkuzi abụọ wakporo ụmụakwụkwọ Ọ sị na anya ụwa niile nọ n'ebe ha nọ iji mara ihe ha ga-eme banyere nyocha na ntaramahụhụ ndị nkuzi ahụ. N'ofesi Onyeisiala mba Cuba bụ Miguel Diaz-Canel ahọpụtala Manuel Marrero Cruz dịka praịm minista mbụ ha n'ime ihe karịrị afọ iri anọ. Cheta Fidel Castro kachapụrụ ọkwa praịm minista na mba ahụ n'afọ 1976 mgbe ọ nọ dịka onye ndu mgbanwe. N'egwuregwu Roberto Firmino scored an injury-time winner as Liverpool defeated Monterrey 2-1 to reach their second Club World Cup final Liverpool amabutela Iko Club World Cup nke mbụ ha site n'imeri ndị Flamengos nke Brazil n'agba nke ịkpeazụ asọmpi ahụ. Ọ bụ otu ọkpụ goolu nke Roberto Firmino nyere na ngwụcha oge nyere ha aka ịmabute iko a. Nkeji
[ "Naijiria", "ụlọ-ọrụ Latrik", "Latrik ọhụrụ", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Muhammadu Buhari", "Ike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50886852
Manchester United a ghọọla itibọrịbọ n'aka Watford
Manchester United gharịpụrụ n'asọmpi ha na ndị Watford bụ nke ha ji ọkpụ abụọ asataghị ihe ruo ala.
2019-12-22T17:14:48Z
Watford vs Man Utd: Osisi kpọrọnkụ a na-atụanya ọdịda nke dị ndụ ekwojiri
Watford na Manchester United Paul Pogba dina ala mgbe a gbaturu ya Ihere mere okwute taa ebe akwa kụwara akị ka ndị Watforf jiri ọkpụ abụọ menye Manchester United ihere taa bụ Sọnde. Watford bu klasi premia lig n'isi nụrụ ya bụ ọgụ ka agụ ihụ na ha jituru Manchester United bụ ndị nke asatọ n'okpokoro lig. Agbanyeghị na Manchester United ji bọọlụ pesenti iri isii na anọ, ndị Watford ekweghị ha ṅụọ mmiri tọgbọ iko. Ya bụ mmeri gbagwojuru ọtụtụ anya maka na Mancherster United emeribuola ihe dịka asọmpị pesenti iri asaa na atọ (73%) bụ nke ha dachiri azụ ka ọ dị ha taa. Onyenkuzi Manchester United bụ Ole Gunnar Solskjaer kwuru nke bụ eziokwu na-eleghị anya n'azụ. Okwuru na "ndị otu m ekwesighị imeri ya bụ asọmpị maka na ha nọrọ ka ọgbọnọ site na mbido ruo na ngwụcha ya bụ asọmpi". Okwukwara na otu ihe ahụ mekwara ndị Watford na mbido mana ha mechere ghọta onwe ha. Aron Wan-Bissaka, Harry Maguire na Juan Mata nke Manchester United ka egbuchiri bọọlụ Ole jakwara Paul Pogba ike na-ekwu na nlọhachite ya bụ uru dịịrị ndị otu ya maka na oji ike na uchu lohachite azụ, agbanyeghị na ahụghị ọkpa ya taa. Onye nyere penarịti ndị Watford bụ Troy Deeney kwukara na obi bụ ha sọ aṅụrị maka ya bụ mmerị mana nke a agaghị eme ka ọ baa ha isi. "Anyị ga-agba mbọ ihụ na anyị adachighị azụ, maka na ndị mmadụ che na anyị ga-agharịpụ". Watford ji ọkpụ goolu abụọ merie Manchester United na ya bụ asọmpi. Ismaila Sarr ji bọolụ ebe Luke Shaw na-eduga ya ozi Ismaila Sarr nke mba Senegal mukere ka kpakpando ta dịka nyere goolu nke mbụ ndị ka onyere aka nwete penariti ahụ nke Deeney nyere. Nke a bụ goolu nke abụọ ya kemgbe amalitere sizin a. Akụkọ ga-amasị gị Ljungberg ọ bụ ngwere dara n'elu jaa onwe ya ike? Mikel Arteta ọ bụ onye nzọpụta ndị Arsenal abịala? Barcelona na Real Madrid kere onwe ha agbụ
[ "Egwuruegwu", "Premier League", "Manchester United" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50886854
Lampard ji ọkpụ goolu abụọ mee Mourinho taa kpuchie ọnụ na be ya
Chelsea ji ọkpụ goolu abụọ asataghị ihe merie Tottenham Hotspur na be ha.
2019-12-22T19:18:25Z
Tottenham Hotspur vs Chelsea: Lampard ji ọkpụ goolu abụọ mee Mourinho taa kpuchie ọnụ na be ya
Tottenham na Chelsea Nke a erie Mourinho ọnụ Ụwa agbaa Jose Mourinho gharị taa ka ahụrụ anyụru n'elu gbara ijiji gharị dịka Frank Lampard ji ya siri osikapa ụbọchị ụka na be ha. Chelsea sụkanyere ọkpụ abụọ tupu alaa ezumike na nkeji nke 12" nakwa nke 45". Ndị otu Mourinho nwere olile anya na ha ga-asa ya bụ bọọlụ mgbe alọtara ya bụ ezumike mana Lampard sị na-ejighi ụtụtụ ama njọahịa erughị na nke a. Tottenham mechere chere na ọ bụ ọgụ ọkpụkpụ aka ka eji emeta ya, mana ọgụ alụtaghị ya. Mateo Kavacic nke Chelsea na Dele Ali nke Tottenham na-esi ogo Dịka Hotspur na-esi ọnwụ ịzọta isi onwe ha ihe niile ọnwụ ahụ nwere ike ịmetere ha bụ penariti maka Son ịgba Rudiger ọkpa. Mourinho mekwara ike ya sịte n'iji Christian Eriksen gbanwee Eric Dier ka anatara ezumike ịji mata ka isi aga apụta. Mana otu 'awụghị' n'ezi. Tottenham gbatara kadị ịdọ aka na ntị (card) ise nke otu n'ime ya bụ nke mmemme (red card) eji chụpụ Son Heung-Min. Son Heung-Min nke Tottenham e bee ebe achụpụrụ ya maka itinyere Rudiger ọkpa Ndị nkwado Tottenham Hotspur malitere isiọnwụ dịka ha bidoro ịtụ gooli ndị Chelsea bụ Arrizabalaga iche. Mmadụ atọ bụ ndị isi ekweọnwụ (Defence) otu chelsea kpachiri ebe niile Hotspur chọrọ isi bata ha ime nke mere na ha agbaghị aka ahịa ma ọlị. Ụfọdụ na-akọwa na ọ bụ Willian nke Chelsea ji okpueze nke asọmpị a, agbanyeghị na ọnwebụgị ihe eji ya kpọrọ ruo ka o gosichara ike ya taa. Akụkọ ga-amasị gị Ljungberg ọ bụ ngwere dara n'elu jaa onwe ya ike? Mikel Arteta ọ bụ onye nzọpụta ndị Arsenal abịala? Barcelona na Real Madrid kere onwe ha agbụ
[ "Chelsea", "Egwuruegwu", "Premier League" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50890117
'Onye anwakwala anwa kwụọ N50 maka POS' - CBN
Gọọmenti Naijriịa ekwuola okwu maka ego POS ndị ahịa na-ana.
2019-12-23T11:14:25Z
POS charge: 'Onye anwakwala anwa kwụọ N50 maka POS' - CBN
Maka ịkwụ ego POS egwe "POS" Ụlọakụ ukwu Naịjriịa agbarụọla ihu kwuo ka ndị mmadụ ghara ịkwụ ya bụ ego ndị na-ere ahịa ụfọdụ na-ama maka iji POS kwụọ ụkwọ. Otu n'ime ndị isi na Central Bank nke Naịjịrịa bụ Musa Jimoh kwuru na ndị mmadụ ghọtahiere ya bụ atụmatụ. 'Ịmachi inye dọla maka ntụbata nri ga-eme ka ndị mmadụ chịrị obi n'aka?' Uru AfCFTA baara ụmụ Naịjirịa Jimoh sị na iwu gọọmenti kwuru ka ndị na-ere ahịa kwụwa ụgwọ nke ha kpọrọ "stamp duty' na Bekee. Mana ọnweghị mgbe ya bụ iwu kwuru ka ndị na-azụ ahịa kwụọ ya bụ ụkwọ, kama na ọ bụ ndị na-ere ere ga-akwụ ya. Ọ sịkwa na ha kwere ndị na-ere ahịa nkwa na ha ga-agba mbọ ihu na ndị ụlọakụ dị iche iche napụtara ndị na-ere ahịa naịrịa iri ise bụ ego stampụ. Jimoh kwusiri ike na "ego stamp" abụghị ndị na-azụ ahịa kwesiri ịkwụ ya". Ọgbakwara ama na Central bank agaghị akwụsịnwu ya bụ ego "stamp" maka na ọbụghị n'aka ha ka ọ dị. Ihe mere e ji nwụchie onyeomeiwu - Uweojii Ndị uweojii Legọs akọwala ihe mere ha nwuchie Shina Peller bụ onye omeiwu nwe ụlọ nkwari a kpọrọ 'Quilox club' dị na Legọs. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Bala Elkana sị na ọ bụ maka Shina Peller na ndị agboro wakporo ụlọ ndị uweojii dị na Maroko. Ha sị na ọ bụ maka kpachikpachi okporoụzọ mere site etu ndị bịara ịṅụ mmanya na Quilox ji dochie ụgbọala n'okporoụzọ Ozumba Mbadi. Ndị uweojii gara buru ụgbọala atọ ndị a sị kwụchiri ụzọ nke mere Shina Peller ji kpọrọ ndị agboro gawa n'ụlọ ndị uweojii. Orji Uzo Kanu na mkpọrọ ya Ụlọikpe ukwu dị na Legọs ajụla ịnabata arịrịo Orji Uzor Kalu rịọrọ ka a tọhapụ ya site n'ụlọmkpọrọ. Ọkaikpe Mohammed Liman sị ka Orji Uzor bụ aka chịburu Abia steeti nọrọ n'ụlọmkpọrọ ruo mgbe ụlọikpe mkpegharị ga-atụle akwụkwọ ọ gbara. Mkpọrọ afọ 12 a tụrụ Kalu gosiri na ịgbaba APC abụghị ịgbanarị ikpe - Rotimi Jacobs Biko tọhapụnụ m ka m gaa ụlọọgwụ - Orji Uzor Kalu Ọkaikpe a jụrụ ihe mere Kalu ji gbapụ ọsọ tinye akwụkwọ a mgbe ụlọikpe mkpegharị achabibeghi ikpe nke mbụ ọ gbara. Cheta na Kalu site n'aka ndị ọkaiwu ya gbara akwụkwọ sị ka ụlọikpe tọhapụ maka na ahụ adịghị ya. E boro Kalu ebubo iri ego dị ijeri naịra asaa na ụma mgbe ọ na-achị dịka gọvanọ Abia steei bụ nke ikpe mara ya. Mmanya akụoyibo egbuola ihe ruru mmadụ asatọ Mmiri akụoyibo bụ ngwa kacha mkpa e ji emepụta mmanya lambanog Ihe ruru mmadụ asatọ anwụọla ka ha ṅụchara mmanya e ji mmiri akịoyibo nke a na-akpọ Lambanog mee, na mba Filipines. Ihe ruru mmadụ narị atọ ọzọ nọ n'ụlọọwgwụ ugbua anata ọgwụgwọ dị ka ha na-ekwuputa maka afọ mgbu na anya ajụ. 'Inwe kabal adịghị njọ' Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari, ekwuola na o nweghi ihe o mere ma e nwee 'Kabal' na-enyere Buhari aka n'ọchịchị. Shehu kwuru na gọọmentị niile dị n'ụwa nwere ụdịrị ndị ahụ, n'ihi na onyeisiala ọbụla ga-enwerịrị ndị na-adụ ya ọdụ nakwa ndị ọ tụkwasịrị obi. Gịnị ka a ga-eme ndị 'yahoo-yahoo'? Otu ngalaba na-arụ ọrụ na-efu ekwuola na ọ ga-aka mma inyere ndị anwụchiri maka igwu wayo nke a na-akpọ 'yahoo yahoo' na Bekee aka, kama ịtụ ha nga. Ngalaba 'VELMA Foundation' ahụ kwuru sị na ntaramahụhụ ahụ anaghị enyere ha aka, kama na ọ ga-aka mma ịhụ na onye ahụ chegharịrị n'ọrụ ọjọọ ahụ ma baara ọha uru. Onye ka Arteta ga-eji mepee akwụkwọ n'Arsenal? Mikel Arteta Kepu kepu si Arsenal apụta na-akọwa na Mikel Arteta ka malitere ịchịkọta Arsenal, amarala ndị ọhụrụ ọ chọrọ ịzụbata. Akụkọ na-ekwu na Arteta agbadola anya ebe Dries Mertens nke Napoli na Kevin Volland nke Bayer Levekusen nọ. Naịjirịa anaghị akwado mmegide okpukperechi - Lai Mohammed Gọọmentị etiti akatọọla aha ọjọọ mba Amerịka kpọrọ Naịjirịa nke ha sị so na mba ndị na-esonye maọbụ na-akwado mmegide mmadụ inwe okpukperechi masịrị ya. Lai Mohammed bụ mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi, kwuru sị na aha ọjọọ a si n'aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ iji okpukperechi akatọ ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari. Iwu ọhụrụ ndị 'Central Bank of Nigeria' tinyere Ndị na-eweta ego ruru puku otu narị naịra nwereike ịkwụ ụgwọ karịa ugboro iri Ụlọakụ gị ga na-anazị gị naịra iri atọ na ise karịa iri isii na ise a na-ana ma i si n'igwe ATM na-abụghị nke ụlọakụ gị dọrọ ego. Nke a bụ makana ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa bụ CBN enyela ha iwu ka ha butuo ya ma wetukwaa aka n'ụfọdụ ụgwọ ndị ọzọ. Ọgụ chara n'ụlọmkpọrọ Ihe ruru ndị nga iri na isii anwụọla ka ọgụ chara n'etiti otu abụọ n'ime ụlọmkpọrọ El Porvenir dị na Tegucigalpa dị na mba Họnduras, na-erughi ụbọchị abụọ ọgụ dapụtara na mkpọrọ ọzọ. Ndị na-arụ na mkpọrọ ndị a sị na e ji ma egbe ma mma lụọ ọgụ a takwara isi mmadụ iri na asatọ n'ụbọchị Fraịde. Oge egwuregwu ndị Manchester City Guardiola bụ onye nchịkọta ha sị na o degaara Premier League akwụkwọ ozi iji sị ha 'daalụ' Ndị Manchester City na-ajụ ndị Premier League ajụjụ maka ntinye oge ha ga-eji agba asọmpi, dịka ha ga-agba asọmpi abụọ n'ime awa iri anọ na isii. Man City ga-ebu ụzọ zute Wolves n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa a, ma zutekwa Sheffield United n'ụbọchị iri abụọ na itoolu. Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji Ihe nkiri a ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Nga", "Manchester City", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Amerika", "Ụlọakụ", "Ofụfe" ]