source
stringlengths
0
47
title
stringlengths
0
100
description
stringlengths
0
502
date
stringlengths
0
20
headline
stringlengths
0
113
content
stringlengths
0
9.43k
tags
sequence
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49924871
Ndị Ipob sị na ndị uweojii wakporo ha na South Africa
Ndị Ipob gara ime ngagharị iwe na Pretoria isi obodo South Africa ka Onyeisiala Buhari gara njem nleta na mba ahụ.
2019-10-03T17:08:15Z
Buhari's South Africa Visit: Ndị Ipob sị na ndị uweojii wakporo ha
IPOB IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti Ihe onyonyo e tinyere na soshal midia na-egosi ọtụtụ ndị otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bucha apa n'ahụ ha nke ha sị sitere na mgbọ egbe ndị uweojii Saụt Afrịka wụrụ ha. Ndị Ipob a gara ime ngagharịiwe n'Obodo Pretoria dịka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari gara njem nleta na Saụt Afrịka. Ipob emeghi 'pịm' ka Buhari wuchiri Japan Ihe Ipob na-achọ karịrị Peter Obi - Paul Achalla Ndị Ipob bụ ndị na-achọ ka ekewaa Naịjịrịa kewapụta Biafra. Ha na-emekarị ngagharịiwe ebe ọbụla onyeisiala Buhari gara njem. Mana Naịjirịa tinyere aha Ipob n'akwụkwọ ha ji ede ndị ha sị bụ ndị oyi egwu. Mgbe BBC Igbo kpọrọ onye na-ahụ maka ndị Naịjirịa na Saụt Afrịka bụ Godwin Adama, ọ sị na ya enweghị ike itinye ọnụ na ya bụ okwu ugbua. "Enweghị m ike ikwu maka ihe ahụ ugbua. Anyị na-akwado ịga rie oriri na be Onyeisiala Saụt Afrịka ugbua." Maazị Adama gara n'ihu kwuo na njem Onyeisiala Buhari na-aga ọfụma. Mana otu onye Ipob n'Abuja aha ya bụ Ụkọchukwu Peace gwara BBC Igbo na ọ bụ ezigbo mgbọ ka ndị uweojii Saụt Afrịka ji gbaa ndi otu ha. Ọ sị; "E burula mmadụ abụọ agbaturu gawa ụlọọgwụ." Agbanyeghi nke a, ụfọdụ ndị Ipob na soshal media kwuru na o bụ mgbọ rọba ka ndị uweojii jiri chụsasịa ha ebe ha na-eme ngagharịiwe. Ihe nkiri e tinyere na soshal midia gosikwara ụfọdụ ndị bu apa egbe dị ka nke rọba ndị uweojii Saụt Afrịka ji achụsa ndi na-eme ngagahrị iwe. BBC Igbo gbara mbọ inweta ndị uweojii Saụt Afrịka n'ekwe ntị mana ha azaghị. Akara soshal midia ha enweghịkwa ihe ọbụla metụtara ndị Ipob dị na ya ruo mgbe akụkọ a pụrụ. Akụkọ a ka dị n'elu, anyị na-esosị ya n'ike. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Cyril Ramaphosa ekwela nkwa na ọzọ agaghị emezi Ndị ntọrị anwụrụla ụmụakwụkwọ isii na Kaduna Gịnị mere nwuchi Abdulrasheed Maina jiri ada ebube? Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "South Africa", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49916769
Isaac Promise, ọgba bọọlụ Naịjirịa, alaala mmụọ n'afọ iri atọ na otu
Isaac Promise bụ onye ji mgbaaka 'captain' mgbe Naịjiria gara asọmpi bọọlụ nke Beijing Olympics' n'afọ 2008.
2019-10-03T17:24:50Z
Isaac Promise, ọgba bọọlụ Naịjirịa, alaala mmụọ n'afọ iri atọ na otu
Isaac Promise Isaac Promise Ihe anya mmiri emekwaala ọzọ n'egwuregwu bọọlụ Naịjiria. Isaac Promise, onye gbaara Naịjiria bọọlụ n'oge gara aga, alaala mmụọ. Nne Gernot Rohr alaala mmụọ Carl Ikeme ọ ga-eso ga Rọshịa? Otu na-elekọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Football Federation' kwuputara nke a n'akara 'Twitter' ha na uhuruchi ụbọchị Tọzde. Promise nwụrụ na mgbede Wenezdee na be ya dị na Austin, Texas nke mba Amerịka. Akụkọ kọrọ na ọ gharịpụrụ na mberede n'ime ụlọ ebe ọ na-anọ agbatị ọkpụkpụ nke Bekee kpọrọ 'Gym'. Promise gaara agba afọ iri atọ na abụọ n'abalị abụọ nke ọnwa Disemba afọ a. Ndị otu Austin Bold FC bụ ebe Promise nọ ugbua ekwuputakwala maka ọnwụ ya. Tupu ọ gaa Amerịka, Promise gbara bọọlụ ọtụtụ afọ na mba Tọkị ebe ọ gbaara otu dị iche iche. Ha gunyere Trabzonspor, Karabükspor, Antalyaspor na ndị ọzọ. Ndị Austin Bold FC ekwuputala maka ọnwụ Isaac Promise. Promise bụ onye ji mgbaaka 'captain' mgbe Naịjiria gara asọmpi bọọlụ nke Beijing Olympics' n'afọ 2008. Naịjirịa ritere ọla ọcha na ya bụ asọmpi n'afọ ahụ. E mechara kpọọ Promise n'otu ndị 'Super Eagles' n'afọ 2009. O so ha gbaa bọọlụ naanị ugboro atọ ma nye otu goolu. Onyeisiala Naịjirịa, Muhammadu Buhari na onyeisiala Saụt Afrịka, Cyril Ramaphosa Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ekwela nkwa na ya ga-eme ihe niile o nwere ike ime iji gbochie mwakpo ndị mbịarambịara na mba ahụ. Ramaphosa kwere nkwa a oge ya na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nwechara nzute n'ụbọchị Tọzdee. Buhari ezipula mmadụ gawa Saụt Afịrịka ozugbo ozugbo Buhari ga-awụchi na Saụt Afrịka ị ma ka eke si anya anwụ Mba Saụt Afrịka arịọla Naịjirịa mgbaghara Mana Ramaphosa kwukwara na ọbụghị naanị ndị Naịjirịa ka a wakporo oge ọgbaaghara 'Xenophobia' dapụtara n'oge gara aga. Ya bụ ọdachi metụtakwara ọtụtụ ndị mba ọzọ tinyekwara ụfọdụ ndị Saụt Afrịka, dịka Ramaphosa si kwuo. Na akwụkwọ ozi nke ha zipuru dịka ha nwechara nzute ha, ndịisiala abụọ a kwuru na mmekọrịta Naịjirịa na Saụt Afrịka ka kwụsiri ike. N'aka nke ọzọ, Buhari kelere Ramaphosa maka nnabata ọ nabatara ya. Ọ katọkwara mwakpo ahụ a wakporo ụmụ Naịjiria n'oge gara aga. Mana ọ gbarụkwara ihu maka ụlọahịa ndị Saụt Afrịka e mebiri na Naịjirịa iji bọọ ọbọ maka mwakpo 'Xenophobia'. Mgbọ atụọla ndị Ipob mmadụ abụọ na Saụt Afrịka Ndị uweojii mba Saụt Afrịka achụsaala ndị otu Ipob bịara ịme ngagharịwi maka Onyeisiala Muhammadu Buhari bịara ebe ahụ. Otu n'ime ndịisi Ipob n'Abuja bụ Reverend Peace gwara BBC Igbo na mgbọ tụrụ mmadụ abụọ. Peace kwuru na ọbụ ezigbo mgbọ ka ndị uweojii gbara ha. Mana ihe onyoonyoo ndị mmadụ tinyere na soshal midia gosiri na ọbụ mgbọ rọba ka a gbara na ngagharịiwe ahụ. Na France N'ofesi, ndị uweojii na France egbuola otu onye ji mma magbuo mmadụ anọ n'isiụlọọrụ ha dị na Paris. Nke a na-eme dịka ndị uweojii mba ahụ gbachara abụbụọrụ maka ajọanya ndị mmadụ na-arọ ha nakwa oke mwakpo a na-eme ha. Ndị okaiwu mba ahụ sị na ha amalitela ịma imi n'ala iji ịmata ebe mmiri sị banye opi ụgbọgụrụ. Lig ndị Yuropu Na Lig nke Yuropu, ndị Arsenal na Standard Liege ga-ezute ebe Manchester United na AZ Alkmaar ga esumpi na elekere asatọ nke abali a. Ndị ọzọ ga-akwata taa bụ RZ Pellets WAC na FC Roma, Besiktas na Wolves na ndị ọzọ. Anya ga-ewetere gi nchịkọta ya mgbe oge ruru. Ndị omekome n'Imo steeti Ndị uweojii n'Imo steeti anwụchiela ihe ruru mmadụ iri bụ ndị na-akpa mkpamkpa ọjọọ na steeti ahụ Ha gunyere ndị otu nzuzo, ndị ohi, ndị na-ere ọgwụ ike, ndị na-egbu mmadụ, ndị na-awakpo nwaanyị nakwa ndị na-atọrọ ụmụaka. Ndị 'Customs' ejichiela anwụrụ ike si Ghana abata Naịjiria Mmadụ abụọ n'ime ndị anwụchiri bụ ụmụnwaanyị ebe ndị ọzọ bụ ụmụ nwoke. Ihe anatara ndị omekome N'ofesi Mba Amerịka agbapeela ụlọ mmekọ ha na mba Somalia bụ nke ha gbachiri kemgbe afọ 1991 mgbe agha dara na mba ahụ. Amerịka kwuru na ha mere nke a iji kwado ọdịnma ha na ndị Somalia nakwa ịwụlite udo na mpaghara ahụ. N'egwuregwu, Otu egwu bọọlụ Naịjirịa adabala n'ọgbọ dị ọkụ ka ahọpụtara ndi ha ga-ezute n'asọmpị AFCON nke ndị obere. Eagles ga-ezute Mali Cameroon nakwa mba Ghana n'ọnwa Nọvemba. Gee nkeji ebe a
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49927844
Ekwensu anya mmeemmee ndị Man Utd abịala ha ụgwọ?
Manchester United achitaghị aja ọzọ n'asọmmpị ha na ndị AZ Alkmaar.
2019-10-03T20:46:58Z
Manchester United vs AZ Alkmaar: Ekwensu anya mmeemmee ndị Man utd abịala ha ụgwọ?
Manchester United Onye ọbụla ga-eche na Manchester United ga-egwe ndị AZ Alkmaar ka ose e ji agwọ abacha. Mana ọ tụrụ ọtụtụ na anya ka agbazụrụ ya bụ egwu bọọlụ, Manchester United gbara aka laa ka afọ ochie. David de Gea bụ aka gọm na-azọ Man United ndụ Manchester United bụ igwe kachasị ebiri bọọlụ ego Premier League: Manchester United ejirila 2-1 merie Leicester City N'agbanyeghị Rashford na ndị agha ha niile, ya bụ Ekwensu anya mmemme bụ 'Red Devils' ndị Man Utd ji abamba, AZ Alkmaar gosiri ha na ha bụ ụkwa a chị n'aka, ọ na-agba. Nke a bụ nke ugboro anọ Manchester United na-agba ọnyụpa. Ole Gunnar Solskjaer Ole Gunnar Solskjaer bụ onye nkuzi ha na-ebo ya ahịhịa na ala ebe ha gbara ya bụ bọọlụ bụ nke ọ sị na "anya m ahụnubeghị ụdị nke ahụ mbụ". Mana onye ga-ekwete ajambele nke a ebe ndị otu ha na-eri ohere niile ha nwere itinye goolu ọkacha nke Jesse Lingard riri n'ikpeazụ. Chi ha zọrọ ha mgbe Myron Boadu nke AZ tinyere otu goolu na agba nke mbụ bụ nke akụchapụru. Ekwensu anya mmeemmee ha anọghị n'ọrụ taa mgbe Stijn Wuytens nke AZ gbatara penariti site na-ịgbatu Marcus Rashford mana anya Referii erughị ya Anya ndị mmụọ bụ "Video Assistant Referee" anọkwughị n'ọrụ na asọmpi Yuropa. Ebe chi United nọ gbutọpụ ha bụ mgbe onye otu ha bụ Lingard merụrụ ahụ nke mere na ha jizi mmadụ iri gbachaa ya bụ bọọlụ. Nke a bụ ọrụaka ekwensụ anya mmeemmee ka ọ bụ gịnị? N'aka nke ọzọ mkpọnaala ndị Arsenal dara oke ụda taa ka ha ji ọkpụ anọ asataghị ihe were suchie Standard Liege ntị. Gabriel Martinelli nyere goolu abụọ ebe Joseph Willock na Daniel Ceballos nyere otu otu. Ihe Standard Liege nwere ike ị mere onwe ha bụ ịgbata mpempe akwụkwọ uhie ịdọaka na nti ebe ha na akpọ ganịganị ka ha gbata ihe. Mana Chi ha egbughị ya taa. Akụkọ ga-amasị gị "Naịjirịa na Amerịka dịka ndị dinta na-achụ otu anụ" - Trump DSS sị m anwala anwa yie uwe Biafra a ọzọ - Chido Onumah Ọ bụ eziokwu na ọrụ amalitela n'ọdọụgbọelu dị n'Enugwu?
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Egwuruegwu", "Manchester United", "Bọọlụ", "Arsenal" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49905476
Lee etu Nigeria na mba Africa ndị ọzọ nweere onwe ha na 1960 si kwụrụ
Anyị jiri mba ndị ọzọ nweere onwe ha n'afọ 1960 were tulee ọganihu na mmepe obodo nke Naijirịa.
2019-10-04T06:00:31Z
Nigeria Independence: Lee etu Nigeria na mba Africa ndị ọzọ nweere onwe ha na 1960 si kwụrụ
Emume nwereonwe Naịjirịa nke 2019 Emume nwereonwe Naịjirịa nke 2019 Dịka Naijirịa na-eme emume nnwereonwe, ụfọdụ na-ajụ kedụ ebe Naijirịa nọ n'ihe gbasara ọganihu. Ha dị ọtụtụ mba n'Afrịka ha na Naịjirịa nweere onwe ha n'afọ 1960. Ha gunyere Gabọn, Mọritenịa, Mali, Bene Repụbụlik, Senigal na Togo. Mba ndị a na-akwadokwa emume ịgba afọ 59 nke ha. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu okpụrụkpụ ndị a Buhari kwuru "Naịjirịa na Amerịka dịka ndị dinta na-achụ otu anụ" - Trump Mba ndị a niile bụ ọgbọ mana Igbo si na "nwoke na ibe ya ha bụ n'ọnụ". Ọ bụrụ n'omenala Igbo, onye gbara afọ iri ise na itoolu ekwesila imezu ihe a tụrụ anya na ndụ ya. Na ntule anyị mere, anyị chọrọ ịchọpụta mba kacha eme nke ọma. Ihe enyochara Ihe ndị anyị ji mee nchọpụta a gụnyere ọnwụ ụmụaka amụru ọhụrụ nke Bekee kpọrọ "Infant Mortality", ogologo afọ ndụ (life expectancy), ụgwọ opekatampe (minimum wage) na nrụrụaka (corruption). Anyị jụkwara onye ọkammụta n'ihe gbasara akụnụba mba bụ Mazi Samuel Iheanyichukwu Ohuabunwa na Dọkinta na-ahụ maka ahụike obodo bụ Ikenna Onoh. Ọkọlọtọ Naijirịa na mba ndị ọzọ 1) Ọnwụ ụmụaka a mụrụ ohụrụ (Infant Mortality) "Ọnwụ ụmụ ọhụrụ ga-ebelata ma a kuziere ndị nne etu esị eledo afọime na ụmụ ọhụrụ ha anya." Ikenna Onoh Ọnwụ ụmụaka a mụrụ ọhụrụ ka njọ na Naịjirịa karịa mba ndị ọgbọ ya. Dịka ndị 'Worldbank.org' si depụta n'afọ 2018, Naijirịa jiri akara 75.7 were bụru onye nke ikpeazụ ebe Senegal bụ onye nke mbụ n'akara 31.8. Ihe na-egosi ọnwụ ụmụaka amụrụ ohụrụ Anyị jụru dibia Bekee bụ Ikenna Onoh onye bụkwa ọkammụta n'ihe gbasara ahụike ọha nke bekee kpọrọ 'public health'. Ọ kọwara na ọtụtụ ihe na ebute ọnwụ nwa amụrụ ọhụrụ kama ọ nwere nke gọomentị kwesịri ime. Onoh kwuru na gọmentị kwesịrị ime ka ụlọọgwụ ruo mmadụ niile aka, ọkachasa ndị bi n'ime obodo na ogbe nkịrika ụlọ. O kwukwara na ọ dịịrị gọọmenti ịgbasa ozi ma kuziere ụmụnwanyi di ime na ndị mụrụ ụmu ọhụrụ etu ha ga-esi ledo ụmụ ha anya. 2) Afọ ole a tụrụ anya mmadụ ibi ndụ (Life Expectancy 2016) Nke a bụ afọ ole a na-atụanya na mmadụ nwere ike ibi ndụ n'obodo ọbụla site na nwata tupu onye ahụ anwụọ. Naijiria gbakwara onye nke ikpeazụ na nnyocha ndị WHO mere n'afọ 2016. Afọ ole a tụrụ anya mmadụ ibi ndụ Ikenna Onoh ji ihe mberede okporoụzo were maa atụ dịka okporo ụzo ọjụọ sọ n'ihe na-ebute ọnwụ erughi eru na Naịjirịa. Ihe mberede mere n'Enugu ataala isi 15 Mberede okporo ụzọ egbuola mmadụ 3 na Lekki Onoh kọwara na mgbe ihe mberede okporo ụzo mere, onweghi ndị gbatagbata nke goomenti ga-abia nyere ndị ihe mberede ahụ metụtara aka. O kwukwara na gọọmenti kwesịri itinye ụchụ n'ịkuziri ndi mmadụ maka ahụike ma rụkwaa ụlọọgwụ ebe ndị mmadụ ga-anata ọgwụgwọ ọrịa maọbụ nnyocha ahụ. 3) Ụgwọ opekata mpe Gọomentị buliri ụgwọọnwa opekatampe site na N18,000 ruo N30,000 n'afọ 2019, mana ebidobeghị kwụwa ya. N'ime mba asaa ndị ha na Naịjirịa bụ ọgbọ, Naịjirịa gbara onye nke atọ na ụgwọ opekatampe. N'ọdịnsoa ka e buliri ụgwọọnwa opekatampe na Naịjirịa ruo puku naịra iri atọ nke pụtara $83.10 ma a tụgharịa ya. Ugwọọnwa opekata mpe 2019 Gabon gbara onye nke abụọ n'onụ $249.27 ebe Mauritania gbara onye nke mbụ n'ụgwo $801.26 opekete mpe. Minimum Wage: Etu ngagharịiwe ndị NLC si aga A ga-amalite ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe N30,000 Mali gbara onye nke ikpeazụ n'ụgwo $47.29 ụgwo opekete mpe. 4) Nrụrụaka (Corruption) Senigal kacha bụrụ mba na-akwụba aka ọtọ n'ime mba asaa ndị a A bịa na nrụrụaka, Naijiria na Mọritenịa bụ ndị nke ikpeazụ n'ime mba asaa ndị a bụ ọgbọ. Nke a bụ dịka ngalaba na-ahụ maka ịkwụba aka ọtọ bụ 'Transparency International' si depụta. Ha nyere Naịjirịa na Mọritenia akara 27/100. N'ụwa niile, mba abụọ a gbara ndị nke 144 n'ime mba 180 ngalaba ahụ nyochara. A hụla ijeri naira 82 ego Abacha zufuru n'ala bekee A ga-akpụpụ Ọkaikpe ukwu Naịjirịa Ụlọikpe? Senigal ji akara 45/100 bụru onye nke iri isi na asaa n'ime mba 180 ndị 'Transparency' nyochara. Kedu ihe bụ Nsogbụ Naịjirịa " Naijirịa ga-eme nkeọma ma anyị nweta ezigbo onye ọchịchị" Sam Ohuabunwa Ọ bụ Okoro etoghị eto wara ọgọdọ na-enye Naijirịa nsogbu? Anyị jụrụ Mazi Samuel Ohuabunwa ihe kpatara o ji dị ka Naịjirịa a na-alaghachi azụ. O kwuru na-enweghị ihe afọ olee Naijirịa dị nwere ime maka mmepe obodo. Ohuabunwa kwuru na Naijirịa na-emebu nke ọma oge a na-eme ọchịchị onye hazie akụ ya nke Bekee kpọrọ 'Regional Government'. Ọbụ mgbe ndịagha batara n'ọchịchị ka ihe niile ghasara. Okonjo-Iweala abụrụla otu n'ime ndị ndụmọdụ na Twitter EFCC Summit: Buhari, ibu agha megide nrụrụaka ezughị ma nkwalite akụnaụba esoghị ya- Kagame Na mpịachi, Ohuabunwa kwuru na ọ bụ ajọ ọchịchị na ajọ ndị ọchịchi mere na Naijirịa etobeghị. Ọ kọwara na Naijirịa nwee ezigbo ndị ọchịchị, na ha ga-etokwute mba ndị ọzọ na eme ọfụma. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Onye wakporo ndị Ipob na South Africa? Ndị ntọrị anwụrụla ụmụakwụkwọ isii na Kaduna Cyril Ramaphosa ekwela nkwa na ọzọ agaghị emezi Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Mali", "Gabon", "Senegal", "Bini", "Mauritania", "Togo", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49924873
Nwa afọ a gbajọrọ Nigeria ga tụtara Bahiain ugo ọlaedo n'asọmpị IAAF
Salwa Eid Naser abụrụ Ebelechukwu Agbapuonwu mgbe amụrụ ya bụzị ọkachagbaa ọsọ 400m.
2019-10-04T10:01:47Z
Salwa Eid Naser: Nwa afọ a gbajọrọ Nigeria ga tụtara Bahiain ugo ọlaedo n'asọmpị IAAF
Salwa Eid Naser Ọbụghị Salwa Eid Naser ka nne na nna ọgbọsọ a dị afọ 21 kpọrọ mgbe amụrụ ya. Nwa agbọghọ a gbafere Miller-Uibo ma merie asọmpị ọsọ 400m nke ụmụnwaanyị na "IAAF World Athletics Championships" nke 2019 bidoro ndụ ka Ebelechukwu Agbapuonwu. Bolt: Ọ masịrị m ịzụ Mamelodi Sundowns Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nkagbuola mkpesa Caster Semenya Nwa ada Naser na-agbaburu Naịjirịa ọsọ tupu o nyefe nkwado ya mba Bahrain. Ka o meriri unyaahu, ọ sị; "Nke a na-agbaka isi! "Ọ bu sọso olilanya ime ọfụma mana ugbua atụọla m ugo." N'afọ 2017 Naser ritere ọra nchara na IAAF agbara na London. Mgbe ahu ọ sị na ya enweghi ihe o ga-agwa ngalaba na-ahụ maka ndi ọgbọsọ na Naịjirịa.
[ "Naijiria", "Egwuruegwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49931404
Uru ekele bara n'ala Igbo
Aha Charles Anazodo na-ewu ewu na soshal midia maka okwu o kwuru na Tiwa Savage ekeleghị ya.
2019-10-04T10:59:11Z
Tiwa Savage na Charles Anazodo: Ihe ekele ji dị mkpa n'ala Igbo
Charles Anazodo na Tiwa Savage Charles Anazodo bụ ome ihe onyonyo Nollywood a ma ama bụ okwu akpụ n'ọnụ ugbua maka ihe o dere na soshal midia. Anazodo kwuru na Tiwa Savage enweghi nsọpụrụ n'ihi na ọ keleghị ya mgbe ọ hụrụ ya n'otu ụlọọrụ mgbasaozi. Tiwa Savage bụ otiegwu a ma ama sara ya na-ajụ onye ka ọ bụ o jighị ga-ebu ụzọ kelee ya? Ihe a gara n'etiti ha mere anyị ji na-ajụ: Kedụ uru ekele bara n'ala Igbo? Otu onye bụ ọkachamara n'omenala Igbo bụ Ositadinma Amakaeze gwara BBC Igbo ihe niile ekele pụtara. Ekele ọ dị mkpa n'ala Igbo? Ihe mbụ o kwuru bụ na "ikele mmadụ bụ omenala Igbo, a tụrụ anya na ọ bụ nwata ga-ekele okenye." O kwuru na ihe ekele dị mkpa n'ihi na ọ bụ ajụjụ ga-enwe asịsị ma nye ohere ịkwu ka ihe siri dịrị gị. Kedụ uru akụkọ ifo baara ndị Igbo? "Ekele bụ ohere ga-ebute mkparịtaụka n'etiti ndị mmadụ" bụ ihe ọzọ o okwuru Nke a ga-ebute mmekọrịta nke Bekee kpọrọ "Communion" n'Igbo niile nakwa n'Afrịka. Ihe ọzọ ekele na-egosi bụ obioma ịnwere ebe mmadụ ibe gị no "Ọ naghị eme ị makwa onye mbụ dịka onye na-eme mpako," ka ọ kọwara. N'okwu Tiwa Savage na Charles Anazodo, ọ kọwara na ndị a ma ama nwere akparamagwa pụrụiche. Ọ sị na ọ bụkwa agwa ahụ nwereike ịme ka Tiwa mee ihe o mere n'abụghị ihe o bu n'uche.
[ "Naijiria", "Omenala", "Abụ", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49937033
Ụlọikpe enyela iwu ka atọhapụ Omoyele Sowore
Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu nyekwara iwu ka Sowore kwụọ otu narị nde naịra nke akaebe tupu a hapu ya.
2019-10-04T12:53:55Z
Omoyele Sowore: Ụlọikpe enyela iwu ka atọhapụ nwa amadi a
Omoyele Sowore Omoyele Sowore Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka atọhapụ Omoyele Sowore. Onye nyere iwu a bụ Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu n'ụbọchị Fraịde, abalị anọ nke ọnwa Ọktoba afọ 2019. Ọkaikpe Ojukwu nyekwara iwu ka a tọhapụ Olawale Bakare bụ onye e ji ya na Sowore. DSS ekwuola na ọ bụ ha nwuchiri Sowore n'ezie Sowore abanyela ofe dị ọkụ ka ụlọikpe nabatara ekpere DSS? "Hapụ Sowore ụgbụa maọbụ..." - Oby Ezekwesili Mana ụlọikpe ahụ kwuru na Sowore ga-akwụ otu narị nde naịra ebe Bakare ga-akwụ nde naịra iri ise tupu ha enwere onwe ha. Ọkaikpe Ojukwu dọkwara mmadụ abụọ ahụ aka na ntị ka ha ghara isonye na ngagharịiwe ọbụla n'ọdịnihu. Ojukwu kwukwara na Sowore na Bakare ga-anọgiderịrị n'ime obodo Abuja. Cheta na otu ụlọikpe enyebuola iwu ka a tọhapụ Sowore, mana ndị DSS kachiri ntị ka jide ya. Sowore zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka e mere n'ọnwa Febrụawarị afọ a. Ọbụkwa ya bụ onye nhazị ngagharịiwe a kpọrọ 'RevolutionNow'. Ọbụ ndị uweojii nzuzo a kpọrọ 'Department of State Service' (DSS) jichiri Sowore na Bakare kamgbe onwa Ọgọst. Ndi DSS boro ha ebubo na ha na-achọ ịkwatu ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari. E bokwara Sowore ebubo iji ụzọ nzuzo bupu ego dị puku kwuru puku dọla. Mana Sowore na Bakare sị na aka ha dị ọcha n'ebubo ndị ahụ e boro ha. Akụkọ na-abịa.
[ "Naijiria", "Ntuliaka obodo Naịjirịa nke 2019" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49931406
Ihe 8 ndị ọzọ mere mbe a nọrọ afọ 344 ji bụrụ ọpụrụiche
Alaga bụ mbe nọ ndụ ruo afọ 344 tupu ọ la mmụọ n'Oyo steeti mana ogologo ndu abụghị sọso ihe pụrụiche maka mbe a.
2019-10-04T13:15:57Z
Ihe 8 ndị ọzọ mere mbe a nọrọ afọ 344 ji bụrụ ọpụrụiche
Mbe pụrụiche Na mbe a na-akpọ "Alaga" - bụ ihe pụtara agadị n'asụsụ Yoroba - nọ ndụ ruo afọ 344 tupu ọ nwụọ bu ihe mere ka ọtụtụ mmadụ na-ada ebube. Mana, mbe a bi n'obieze na-achị Ogbomosho nwere ihe ndị ọzọ so ya na-atụ ndị mmadụ n'anya. Echere na mbe ahụ nke ọtụtụ ndị mmadụ na-efe efe ga-atọ mbe niile bi n'ụwa tupu ọ nwụọ. Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo? Ihe mere Igbo ji achụpụ mmadụ n'ajọ ọhịa Tupu o nwụọ, kwa ụbọchị, narị kwuru narị mmadụ na-aga n'obieze Soun na-achị ọgbọmọshọ akwanyere ya ugwu. Akụkọ oge gboo kwuru na ọ bụ Soun nke chịrị site n'afọ 1770 rue 1797 butere ya n'obieze ahụ mgbe ọ hụrụ ya n'ọhịa ka o si agha alaghachite. Lee ihe ndị ịmaghị maka mbe a pụrụiche: 1.A na-akpọ ya Alagba n'asụsụ Yoroba, nke a pụtara Okenye. 2.Nna nna onye bụ eze ugbua chọtara n'ime ọhịa mgbe o si n'agha alaghachite. 3.Ọ na-eri nri niile mmadụ na-eri dịka Amala, osikapa, agwa, plantain, na ogede. 4.Ndị ọkachamara ndị ọzọ nwere nkwenye na mbe Ogbomosho bikarịrị agbụrụ mbe ndị ọzọ na ndụ. 5.O nweghi dọkịta Bekee bịara mbe ahụ nso maọbụ gbaa ya ọgwụ na ndụ ya niile. 6.A na-enye ya nri sọsọ ugboro abụọ n'ime ọnwa, ọ naghịkwa apụ apụ nanị ma ọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ. 7. Ndị mmadụ na-aga ekpere ya maọbụ nata ya onyinye maka ihe ọbụla ha chọrọ. 8) Mbe ogbomosho a nwere ndị na-eleta ya iche n'obieze Soun dị n'Ogbomosho Ihe onyonyo ga-amasị gị Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị Uru ekele bara n'ala Igbo Gịnị na-eme ụmụakwụkwọ Queens College ọzọ? Agbaala ndị mgbere nwa n'anwụ
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Anụmanụ", "Akịọlọji", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/mba-uba-49934803
Nyenu ụmụ Nigeria ohere anyị nyere unu - okwu Buhari gwara South Africa
Onyeisiala Muhammadu Buhari ezutela ndị Naịjirịa bi na South Africa ka njem ya na mba ahụ banyere abalị nke abụọ.
2019-10-04T14:32:45Z
Xenophobia: Nyenu ụmụ Nigeria ohere anyị nyere unu - Buhari
Buhari na Ramaphosa na Pretoria Ka njem Onyeisiala Muhammadu Buhari na mba Saụt Afrịka banyere abalị nke abụọ, o zutela ndị Naịjirịa bi na mba ahụ. Buhari gwara ụmụ Naịjirịa bi na Saụt Afrịka ka ha na-erube isi ma na-ezere ihe ọ bụla ga-ebute akpọmasị n'ihi na ọbụ ihe ha mere ka a ga-eji kpee ha ikpe. Ndị Ipob sị na ndị uweojii wakporo ha na South Africa "Ihe e mere anyị bụ ihe nyere anyị mbọmbọ ọsọ na South Africa"- Nwaanyị Igbo si SA agbalaga Buhari sịkwa ha buru n'obi na ha bụ ndị nnọchịte anya Naịjirịa n'ebe ọbụla ha nọ. O tinyekwara ọnụ na mwakpo a na-awakpo ndị Naịjirịa na ndị mba Afrịka ndi ọzọ na Saụt Afrịka. Emere nzukọ a Buhari na ụmụ Naịjirịa nwere na mkpuchi. Ekweghi ndi ntaakụkọ BBC na ndị ọzọ banye ebe nzukọ a na-eme. Nke a nwereike ịbụ maka ọgbaaghara ndị otu Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) mere ụnyaahụ. Ndị Ipob ruru iri atọ gara na ụlọ Union Building na-asị ka Buhari pụta bịa zute ha. Ndị uweojii mechara jiri mgbo egbe rọba chụsasịa ha. Mgbọ tụrụ mmadụ ụfọdụ n'ime ha ma merụo ha ahụ. Onyeisi Ipob bụ Nnamdị Kanu mechara gbasa ozi maka ihe ahụ mere. Kanu katọrọ ihe ndị uweojii Saụt Afrịka mere ma kwuo na ha ga-enyocha ya bụ ihe iji mara ebe ha kwụ. Buhari na onwe ya si na obi di ya ụtọ etu Saụt Afrịka si nabata ya ma kwuo na ha agwala Onyeisiala Cyril Ramaphosa ka ọ bịa ka Naịjirịa lee ya ọbịa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ụlọikpe enyela iwu ka atọhapụ Omoyele Sowore Lee etu Nigeria na mba Africa ndị ọzọ nweere onwe ha na 1960 si kwụrụ Ihe 8 ndị ọzọ mere mbe a nọrọ afọ 344 ji bụrụ ọpụrụiche
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "South Africa", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49946382
'Ọ bụ ndị Uweojii gbara ụlọ anyị ọkụ' - Ndị Aba
Ndị mmadụ bi n'ogbe akpọrọ Okojombo, Degema dị na Ndiegoro, Aba nke dị na Kansulu Aba South n'Abia steeti e boola ndị Uweojii ebubo na-ọbụ ha gbara ụlọ obibi nakwa ụlọ ahịa ha ọkụ.
2019-10-05T13:10:21Z
'Ọ bụ ndị Uweojii gbara ụlọ anyị ọkụ' - Ndị Aba
Ndị mmadụ bi n'ogbe akpọrọ Okojombo, Degema dị na Ndiegoro, Aba nke dị na Kansulu Aba South n'Abia steeti e boola ndị Uweojii ebubo na-ọbụ ha gbara ụlọ obibi nakwa ụlọ ahịa ha ọkụ. Mgbe BBC Igbo rutere ebe ahụ iji hụ ka njinji ahụ siri jie, a hụtara etu ọkụ siri gbapịa ụlọ ruru asatọ n'ọnụọgụgụ, bụ ebe ndị mmadụ bi nakwa ebe ụfọdụ na-ere ahịa. Dịka BBC Igbo siri hụta, ngwongwo ọnụ ego ya ruru ndekwuru nde naira bụ nke ọkụ tapiara, bụ nke gunyere ngwa ahịa dị iche iche, otu ụgbọala ụlọ nakwa ọtụtụ ngwongwo eji biri na ha. Dịka ndị nke a metụtara siri gwa BBC Igbo, ihe butere ihe mberede a bụ etu ndị uweojii ji abiakari n'ogbe ahụ oge ọbụla ma na-anakọrọ ndị mmadụ nakwa ndị ọkwọ ụgbọala ego ha. Ha gara n'ihu ma kọwaa na njinji a malitere n'ụbọchị Fraịde izu gara aga, oge ndị uweojii nakwa ụfọdụ ndị ọkwọ ụgbọala bidoro inwe nghọtahie gbasara ego. Akụkọ kọrọ na ndọrọndọrọ a butere ọnwụ otu onye uweojii, bụ nke butere oke ịkwarịta mgbọ n'ebe ahụ. Dịka ụfọdụ ndị mmadụ gbapuru n'ebe ahụ maka ize ndụ, ọtụtụ merụrụ ahụ, ebe e bokwara ndị uweojii ebubo na ha gara n'ihu kụkawa ụlọ mmadụ ma bukorowa ngwongwo ha. Ha kwuru na ihe a gakwara n'ihu na-eme site n'ụbọchị Fraịde ma rue Tuzde izu ụka a bu mgbe ha biara munye ọkụ n'ebe ahụ ma bukorochaa ihe ndị mmadụ nwere. Oge ha na-agwa BBC Igbo okwu, ndị a ihe a metutara kwara ariri na kamgbe ihe mechara, ha ka nọ n'ụjọ dịka ndị uweojii ka na-agagharị, na-eyi ndị bi n'ogbe ahụ egwu, dịka ha kpochirila ọtụtụ mmadụ nakwa ụmụaka nụlọ mkpọrọ. Ha gaziri n'ihu ma kpokuo Govano Okezie Ikpeazu na-achị steeti Abia ka ogbatara ha oso enye m aka na-ajo onodu a. Ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka gwaburu BBC Igbo na onweghi onye ga-awakpo nwa Abia steeti gbara aka laa. Ọ aka na-achị steeti ahu bụ Okezie Ikpeazu ma maka n'okwu gbasara mwakpo akwakporo ndị mpaghara Ndiegoro ma na-etuntekwe anya na ya. BBC Igbo gbakwara mgbọ ịnụta nke bu eziokwu n'ọnụ Geoffrey Ogbonna bụ ọnụ na-ekwuru uweojii n'Abịa steeti mana ọ zaaghị.
[ "Abia Steeti", "Nchekwa ndị ụwe ojii" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49946491
Brighton asapụla Tottenham ọcha ka azụ ite
Otu egwu Brighton ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu gbaa Tottenham ose n'anya n'asọmpi Premier League.
2019-10-05T13:48:03Z
Brighton vs Tottenham: Asapụla tottenham ọcha ka azụ ite
Brighton vs Tottenham Oke anya ajụ na-apa ndị Tottenham site n'ọkpụ goolu atọ a na-asataghị otu ndị Brighton ji saa ha isi. Dịka asọmpi melitere na nkeji 3, Brighton ji otu ọkpụ goolu sị n'aka Neal Maupay sị ndị Tottenham 'Unu abịala'? David de Gea bụ aka gọm na-azọ Man United ndụ Man Utd agwala Tottenham na akpụkpọụkwụ nwere 'size' Tupu Tottenham ahọta ihe egwu na-akụ, Aaron Connolly nke Brighton nyere ha goolu ọzọ na nkeji 32. Nke a tinyere Tottenham na gbagharịa dịka ha enweteghi onwe ha ruo na ngwụcha ọkara mbụ. N'ime ọkara nke abụọ na nkeji 65, nwa amadị Aaron mere onwe ya aha ọzọ mgbe o mezuru goolu ha ọkpụ atọ. Barcelona etiela Liverpool ịgba Liverpool asụọla atịkpa fenye Tottenham ajụ n'anya Tottenham siri ọnwụ niile ha nwereike ka ha nyeta ọ bụ naarị otu ọkpụ goolu mana Brighton foro ntụtụ taa na nke a agaghị eme. Cheta na Bayern Munich gbara Tottenhem ọkpụ goolu asaa asatara abụọ n'ụlọ n'asọmpi Uefa Champions League n'ime izuụka a. Mmeri a e meriri Tottenham dosara ha na ndị isii n'ogogo tebụlụ Premier League.
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49946385
David Cameron ewerela asị ọcha wụkwasa m n'isi - Goodluck Jonathan
Goodluck Jonathan sị na ihe David Cameron dere maka ya n'akwụkwọ ọhụrụ ya a kpọrọ "For the Record" abụghị eziokwu.
2019-10-05T15:11:15Z
David Cameron ewerela asị ọcha wụkwasa m n'isi - Goodluck Jonathan
Goodluck Jonathan na David Cameron Onye bubụ onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan akpọla onye bubụ praịm minista mba Briten bụ David Cameron aha na Facebook maka ụgha ọ si na o dere n'akwukwọ o bipụtara ọhụrụ. Akwụkwọ Maazị Cameron "For the Record" bụ nke o ji kọwa ihe mere n'ọchịchị ya bụ nke bịara na njedebe mgbe ndị sị na ha chọrọ ịpụ na Yurop meriri na ntuliaka e mere n'afọ 2016. Ihe Goodluck Jonathan kwuru maka Saraki Jonathan asaala okwu n'ebubo na o nyere Olisa Metu N400m Goodluck Jonathan: Etu Obama megidere m ịzọgharị na ntuliaka 2015 Cameron rituru n'ọkwa makana o so na ndị chọrọ ka ha nọdụ na Yurop. Ndị odee nyochara akwụkwọ a kọwara na Cameron ji ya kọwa ebumnuche ya n'ihe banyere atụmatu "Brexit" nakwa etu ọchịchị ya siri gaa. Ka a na-ekwu maka akwụkwọ na mba ofesi, ihe a Jonathan dere n'akara Facebook ya nwereike mee ka akụkọ ya bụrụ okwu akpụ n'ọnụ, ọkachasị etu a Maazị Jonathan si tinye ya ọnụ. Jonathan sị na akwụkwọ a kwuru na ya na gọọmenti ya tinyere aka na mpụ na nrụrụaka, ma kwukwa na ọ gbajọrọ enyemaka mba Briten chọro inye maka ụmụ Chibok atọọrọ. Jonathan sị; "Ọ bụghị eziokwu na onwere mgbe Maazi Cameron sị ka ha nyere anyị aka. Edere m akwụkwọ nye ya, Barack Obama, Fancois Hollande na Benjamin Netanyahu ka ha bịa nyere anyị aka gbapụta ụmụ Chibok." Maka ebubo nrụrụaka ọ sị na-eboro ya, Jonathan sị na nchọpụta ngalaba na-enyocha mpụ a kpọrọ "Transpacency International" n'afọ 2014 gosiri na Naịjirịa ka mma mgbe ahụ rukwa ugbua. Maazị Jonathan gara n'ihu kwuo na Maazị Cameron na-eburu ya ihu, ma rụtụ aka na onwereike bụrụ makana ya binyere aka n'iwu machiri nwoke ịlụ nwoke ibe ya. Ọ sị na ọbụghị ya bụ mbụ na-ebo Cameron ebubo maka ụgha di n'akwụkwọ ya nke ọ ga-abụ onye ikpeazu. Goodluck Jonathan dekwara akwụkwọ nke ya ọ kpọro "My Transition Hours". Ụfọdụ ndị so ya rụọ ọrụ pụtara gbarụọ ihu na ihe edere maka ha n'ime akwụkwọ ahụ abụghị eziokwu. Ma mkaparịtụka ya na BBC nwere, Jonathan kwuru maka njem ya na ụmụ Chibok na ndị ọchịchi ofesi a dịka Barack Obama nke Amerịka. Lee ihe o kwuru. BBC Igbo gbara mbọ ịnwete ọnụ na-ekwuru Maazị Jonathan bụ Ikechukwu Eze mana ọzaghị ekwneti ya.
[ "United Kingdom", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Brexit" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49944182
Ụmụakwụkwọ Chibok anọọla ụbọchị 2000 n'aka Boko Haram
Taa ga-eme ya ụbọchị 2000 ụmụakwụkwọ Chibok nọrọla n'aka Boko Haram kamgbe afọ 2014 a tọrọ ha.
2019-10-05T18:52:32Z
Chibok Girls: Ha anọọla ụbọchị 2000 n'aka Boko Haram
Akụkọ dị mkpa: Ụmụaka Chibok anọọla ụbọchị 2000 n'aka Boko Haram Otu Bring Back Our Girls na ndị nne na nna etiela mkpu n'oke olu maka ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị Chibok ka nọ n'aka ndị Boko Haram kamgbe ihe karịrị afọ ise. Ha na-ebe akwa na gọọmentị achọghị ịgba mbọ ka a tọhapụ ụmụaka 112 fọrọ afọ n'ime ihe karịrị 200 a tọọrọ. Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ncheta ụmụakwụkwọ Chibok Ụmụakwụkwọ 50 efuola na mwakpo Yobe steeti Otu a riri uju iji chetara ụbọchi puku abụọ ụmụaka ndị nọrọla n'aka ndị Boko Haram bụ ndị tọrọ ha n'ụbọchị 14 Eprelu, 2014. Otu BBOG wepụtara akpụkpụ dị 112 e dere aha ụmụaka ndị a, nke Leah sheribu na ndị ọrụ enyemaka abụọ Alice Ngaddah na Grace Taku. Ha gosiri akpụkpụ ụkwu ndị a n'ogige Unity Fountain dị n'Abụja n'ụbọchị Satọde bụ abalị ise nke ọnwa Ọktoba afọ 2019. Nyesom Wike emeriela n'ụlọikpe Ụlọikpe dị na Rivas Steeti ekwuola n'ezie na ọ bụ gọvanọ Nyesom Wike meriri na ntuliaka afọ 2019 dịka ọkaikpe K.A Ojiako si kwuo. Ụlọikpe a sị na onye ji aha ADP zọọ ọkwa gọvanọ mere mkpesa bụ Victor Fingesi ga-akwụ ụlọọrụ Inec, gọvanọ Wike na PDP ego dị puku narị naịra atọ n'otu n'otu. N'ofesi Ihe ruru mmadụ otu narị anwụọla na ngagharịiwe na-eme na mba Iraq megide gọọmentị ha. ebe ihe karịrị mmadụ puku atọ merụrụla ahụ n'ọgbaghaara ahụ. N'egwuregwu Tottenham makwara afọ n'ala ọzọ dịka Brighton ji ọkpụ goolu atọ saa ha ahụ n'asọmpi Premier league Nke a ga-eme ugboro atọ a ga-emeri ha n'ime otu izuụka. Brighton asapụla Tottenham ọcha ka azụ ite Nkeji Ihe nkiri Onyeisiala Buhari na ụmụ Naịjirịa bi na Saụt Afrịka Ụmụ Naịjirịa ha na onyeisiala Buhari nwere ọgbakọ na Saụt Afrịka Osote odeakwụkwọ ndị otu a kpọrọ onwe ha Nigerian Citizens Association in South Afrika tiri mkpụ a na nzụkọ mkpuru ha na onyeisiala nwere na Saụt Afrịka.N'ofesi, Ụmụ Naịjirịa gbakọrọ na mba Saụt Afrika ịzụte Onyeisiala Muhamdu Buhari ebesalara ya akwa arịrị maka ụdị mkpagbu na mkpachapụ chere ha n'ihu na mba ahụ. Osote odeakwụkwọ ndị otu a kpọrọ onwe ha Nigerian Citizens Association in South Afrika bụ S J Uba tiri mkpụ a na nzụkọ mkpuru ha na onyeisiala nwere na Saụt Afrịka. Ndị Ipob sị na ndị uweojii wakporo ha na South Africa Nyenu ụmụ Nigeria ohere anyị nyere unu - okwu Buhari gwara South Africa Ndị Ipob sị na ndị uweojii wakporo ha na South Africa Ndị otu a gwara Buhari na ndị uweojii, ndị ọrụ nchekwa na dị mba ahụ na elegere ndị Naịjirịa anya ka ndị ekperima. Ihe ọzọ pụtara na njem Saụta Afrịka onyeisiala mere bụ na mba abụọ ahụ ekwekọrịtala ị na enye visa afọ iri n'ofu nje maka ndị ọchụnta ego, ụmụakwụkwọ na ndị na-emekarị njem. Nasir El-Rufai sị na ụmụaka ahụ atọọrọ ga-apụata Ụnụ anụkwanụ e, na ndị ntọ tọọrọ ụmụ agbọghọ isii n'ụlọakwụkwọ dị na akụkụ Kaduna ụbọchị tọzde akpọọla okwu aha ihe a ga-enye ha tupu ha tọhapụ ụmụaka ahụ. Gọvanọ steeti ahụ bụ Nasir El-Rufai sị na ha na ndị ahụ na-ekweọnụ, mana o kwughị egoole ha kpọrọ aha. Ụmụ Aba ka na-ebe maka ọkụ agbara Ndị mmadụ na mpagaghara Aba ka na-eti mkpu maka mkpamkpa ha sị na ndi uweojii kpara n'ogige ha n'izu a. Ọfọdụ ndị agbara akụnaụba ha ọkụ sị na ndị uweojii ha sị kpara ike a bịara njem mmebi ihe ruo ugboro ano kemgbe nsogbu a malitereka dịka ndị amatabeghị gburu onye uweojii. Onyeisi ndi uweojii n'Abịa bụ Eneh Okon na-agọ na ọbụghị ndị ọrụ ya mere ihe a. Egwu họrọ Dele Alli N'egwuregwu, egwu ahọọla nwafọ Naịjrịa na-agbara Ingladị bụ Dele Alli n'asọmpi Urop 2020. Nke a dị na-akwụkwọ onye nkuzi Inglandi bụ Gareth Southgate biputara n'izu a. Gee akụkọ ndị niile n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị Gịnị na-eme ụmụakwụkwọ Queens College ọzọ? Ihe ndị bu ọtụ na amụ na-agabiga Buhari ga-awụchi na Saụt Afrịka ị ma ka eke si anya anwụ
[ "Kaduna", "Boko Haram", "Kaduna steeti", "Naijiria", "Riva steeti", "Ntọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa", "Bọọlụ", "South Africa", "PDP (People's Democratic Party)" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49916776
Ọgọ ukwu ndị Igbo nwere na mba
Ị ma ama na ụmụnwaanyị Igbo so na ndị na-eweta ọkụ na Naịjirịa, leezia ndị na-ewu ewu bụ ọgọ ndị Igbo.
2019-10-06T04:57:41Z
Ọgọ ukwu ndị Igbo nwere na mba
Paul Adefarasin, Kerry Washington na David Adeleke. Ndị Igbo tụrụ ilu sị na "Ọgọ bụ chi onye" Ya mere anyị ji bido ngụkọ ọgọ ndị Igbo nwere na mba na-eme ha ihu ọma. Ihe ọ na-ewe iji lụ nwaanyị na Mbaise Ihe ndị ị kwesịrị ịma tupu ị lụọ nwaanyị Igbo Akụkọ a ga-egosi ndị aha ha na-ada ụda na mba niile bịara ala Igbo maka ịlụ di maọbụ nwunye. Lee ụfọdụ ndị ọgọ ndị Igbo ji eme ọnụ. David Adeleke (Davido) David Adeleke maọbụ Davido bụ onye otiegwu si mba Naịjirịa ude ya n'ede n'ụwa niile. Ọ bụ onye obodo Ede dị na Ọshụn steeti. Davido: Ihe jịkọrọ ya na Ndigbo Davido egechiela Chioma! N'ọnwa sepụtemba afọ a ka ọ gbanyere enyi ya nwaanyị bụ Chioma Leonard mgbaaka alụmdịnanwunye mana ha agbabeghị akwụkwọ. Kerry Washington Kerry Washington na Nnamdi Asomugha Kerry Washington bụ onye obodo Bronx dị na mba Amerịka. Ọ bụ onye ome ihe onyonyo a ma ama na Hollywood nke mba Amerịka. Nke kachasị eji mara ya bụ "Scandal" Ọ lụrụ Nnamdi Asọmụgha n'afọ 2013. Ha ji ụmụ abụọ Rotimi Akeredolu Rotimi Akeredolu bụ otu n'ime ndị ọkaiwu kachasị na Naịjirịa bụ SAN n'aha ịchafụ. A mụrụ Akeredolu n'obodo Ese Odo dị na Ondo steeti. Ọ lụrụ nwunye ya bu Betty Anyanwu-Akeredolu n'afọ 1990. Ha ji ụmụ anọ. Fani Kayode Femi Fani Kayode maọbụ FFK dịka aha a na-etu ya bụ onye Ile-Ife Oshụn steeti amụrụ na Legọs. Ọ bụ onye ọkaiwu na onye ọma mbem rụburu Naịjirịa ọrụ dịka Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu site n'afọ 2006 rue afọ 2007. Nnamdi Kanu: Abaribe na Fani-Kayode ga-agwa anyị ka o si gbapụ na Naịjirịa Juun 12: FFK, Fayose na nwa Abiola kwadoro Buhari Ọ lụrụ Precious Chikwendu n'afọ 2014. Ha ji ụmụ nwoke anọ. Paul Adefarasin Paul Adefarasin bụ onye obodo Ijebu ode na steeti Ogun nke Naịjirịa. Adefarasin bụ ụkọchukwu ụlọụka "House on the Rock" nke ọ wụlitere n'afọ 1994. Ọ lụrụ nwunye ya bụ Ifeanyi Paul Adefarasin n'afọ 1995. Ha ji ụmụ atọ Ibrahim Badamosi Babangida Ibrahim Babangida na nwunye ya nakwa Okparaeze Charles na Lady Diana bụbu nwunye ya Ibrahim Badamosi Babaginda bụ onye obodo Minna dị na Naịja steeti. Ọ bụ ọchịagha chịrị ala Naịjirịa site n'afọ 1985 rue afọ 1993. Ọ lụrụ Maryam King Okogwu n'afọ 1969. Ha mụrụ ụmụ anọ mana Maryam nwụrụ n'afọ 2009. Ivara Esege Ivara Esege bụ di ọdeeakwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Ngozi Adichie. Esege bụ onye si mba atọ bụ Naịjirịa, Briten nakwa Amerịka Ọ bụ dọkịta Bekee na'obodo Maryland na mba Amerịka bụ ebe ya na ezinaụlọ ya bi. Ọ lụrụ Chimamanda Adichie n'afọ 2009, ha mụta otu nwata nwaanyị. O nwere ndị ọzọ ị chere kwesiri ịnọ ebe a? Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị Gịnị na-eme ụmụakwụkwọ Queens College ọzọ? Agbaala ndị mgbere nwa n'anwụ "Naịjirịa na Amerịka dịka ndị dinta na-achụ otu anụ" - Trump
[ "Ezinụlọ", "Naijiria", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/49950408
Etu ndị nkuzi Anambra si piachakọrọ nturugo nke onyeisiala
Ọ bụ eziokwu na ụbọchị ewepụtara maka icheta ndị nkuzi n'ụzọ pụrụiche agafeela mana ndị nkuzi Anambra steeti ka na-enwe anụrị maka nturuugo ha.
2019-10-06T07:59:27Z
Teachers' Day: Etu Anambra si kpokọrọ nturugo nke onyeisiala
Onye nkuzi Ndị nkuzi nọ n'Anambra steeti ritere nturuugo anọ n'aka onyeisiala Muhammadu Buhari dịka e mere ncheta ndị nkuzi n'ụbọchị ise nke ọnwa Oktoba. Nturuugo a bụ nke a na-enye ndị nkuzi na ụlọakwụkwọ bụ ọkaibe na Naịjirịa dịka ụlọọrụ mgbasaozi "Anambra Broadcasting Commision"(ABS) si depụta. Ụmụaka Igbo eturula ugo ọkaibe na teknụzụ na mbaụwa Nturuugo ha ritere gụnyere Ụlọakwụkwọ bụ ọkaibe na nchịkọta ụmụakwụkwọ na Naịjịrịa gaara Maria Regina Model Comprehensive Secondary School dị na Nnewi Ụlọakwụkwọ ọha bụ ọkaibe na Naịjirịa gaara Flora Azikiwe Model Secondary School dị na Neni. British Spring College Awka site n'aka onye nkuzi ha bụ Arinze Izuegbunam ritere nturuugo n'ogo mbụ ọkaibe n'ụlọakwụkwọ naa-abụghị nke ndị gọọmenti Samuel Izuegbu na-akụzị na 'Community secondary School' dị n'Owerri Ezukalla ritere ogo nke abụọ na nturuugo ọkaibe n'ụlọakwụkwọ ọha. Onyeisiala Buhari site n'ọnye nnọchite anya ya na mmemme ya bụ okaipe ukwu nke Naịjirịa bụ Abubakar Malami SAN, kwuru na obi dị ya ụtọ maka isiokwu ncheta ndị nkuzi nke afọ a makana ọ gbadoro ụkwu na etu ndị nkuzi ga-esi na-akụziri ụmụakwụkwọ ihe ndị ga-enyere nwulite obodo aka akwụsị akwụsị. O kwukwara na a ga-enwetali agụmaawụkwọ zuruoke na Naịjirịa site na nnabata, nghọta, nakwa ịnwe nghọtata maka ndịche ụmụakwụkwọ ụfọdụ nwere. Kọmishọna na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Anambra steeti bụ ọkammụta Kate Omenugha kwuru na mmeri a gosiri na nkwado gọọmenti Anambra na-enye agụmaakwụkwọ na steeti ahụ abụghị na nkiti. Cheta na isiokwu nke ụbọchị ncheta ndị nkuzi nke afọ a bụ 'Ndị nkuzi ntoroọbịa: Ọdinihu ọrụ nkuzi. N'afọ 2017, Clement Nwoye Okodo bụkwa onye Anambra steeti ritere nturuugo onye nkuzi kachasị na Naịjịrịa nke onyeisiala hibere. Akụkọ ndị ga-amasị gị Ndị Naịjirịa so napụta ndị ọcha ọchịchị Ụmụakwụkwọ Chibok anọọla ụbọchị 2000 n'aka Boko Haram Nyenu ụmụ Nigeria ohere anyị nyere unu - okwu Buhari gwara South Africaa
[ "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49950409
Pope Francis a ga-ekwe ka ndị 'Fada' bido lụwa nwaanyị?
Ndị ụkọchukwu ụka katọlịk na mbaụwa niile ezukọla na Vatican ka ha kpa maka ọdinihu ụka Katọlik na Amazon.
2019-10-06T11:12:22Z
Catholic Bishops: Pope a ga-ekwe ka ndị 'Fada' bido lụwa nwaanyị?
Pope Francis Ndị ụkọchukwu Katọlik kọrọ ụkọ n'ọtụtụ ebe na Amazon Okwu gbasara ndị 'fada' ịlụ nwaanyị abụghị nke malitere taa mana e dịkwaka enwere ike isu ya kpọm taa. Ndị ụkọchukwu ụka Katọlịk si akụkụ mbaụwa niile ezukọla ka ha kpa ihe dị iche iche dịka mgbanwe eluigwe, mbịara mbịara, mana isi sekpụ ntị na ha niile bụ ma ụmụnwoke nụrụla nwaanyị a ga-bunwu ụkọchukwu. Pope Francis emeela ihe Pope ọbụla emebeghi Pope: Ikpe ọnwụ bụ mmetọ ugwu ruru mmadụ Otu ihe kwụpụtara n'akwụkwọ eji eme nzụkọ a bụ atụmaatụ nke gunyere ka ndị agadị nwoke lụgoro nwaanyị bi na Amazon na-echi ụkọchukwu. Akwụkwọ a na-ekwukwa na agadị nwoke ndị a ga-abụrịrị ndị na-akwanyere onwe ha ugwu ma sikwa n'ebe ha chọrọ ịnọ rụọ ọrụ chukwu. Ndị Ụkọchukwu nọ na Saụtụ Amerịka tụtara alọ a ka e wee gbochie nsogbu ụkọ ndị ụkọchukwu n'ogbe ahụ. Nsogbu a butere na a naghị aka 'Masi' n'ọtụtụ ebe n'obodo ahụ. O nwere ihe dị njọ n'atụmaatụ? Ọtụtụ ndị na-ahụta ndị ụkọchukwu dịka ndị na-ekwesighị ịlụ nwaanyị dịka ọkwa ahụ si nye makana ọ bụ Chukwu na-alụ ya. Okammụta Linda Woodhead MBE kwuru na a na-enye ndị 'Fada' ihe ọbụla ha chọrọ dịka ego ụlọ na ego ha ga-eji na-egbo mkpa ka ha wee rụọ orụ ha ọfụma. "Ndị mmadụ na-abịakụte 'Fada' dịka onye na-enweghị ihe ọbụla ha nwereike ịna-eze, ụkọchukwu ahụ ga-anatụ anya ha , nke a bụ ihe kachasị mkpa," n'okwu ọkammụta Woodhead. Ndị omenaala na-ekwu na ya bụ nzụkọ a na-enwe n'obodo Amazon nwereike ịla ụka n'iyi ebe ụfọdụ ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na amalite ya bụ atụmaatụ na ọ ga-emebisi alụghị nwaanyị ndị ụkọchukwu Katọlịk. Ha na-echekwa na enwereike ịtụta alo gbasara udiri echichi ụkọchukwu a gana-echi ụmụnwaanyị nke ga-eme ka malite chiwe ha ụkọchukwu. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mparịtaụka a @3Loretto kwuru na ọ gaghị ekwe ka atụmaatụ ọjọ a gaa n'ihu. @selicia_f kwenyere. @ThomasJTobin1 kwuru na o nweghị ihe ndị mmadụ ga-emeli maka ya bụ mkparịtaụka n'ọgbakọ ahụ kama ha kpe ekpere maka ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị Gọvanọ Borno steeti akpọtala ndị nsọ 30 ga-eji ekpere memila Boko haram Etu ndị nkuzi Anambra si piachakọrọ nturugo nke onyeisiala Ọgọ ukwu ndị Igbo nwere na mba
[ "Pope Francis", "Ụka ndị Roman", "Latin America" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49954269
Wolves akwụọla ụgwọ isi Man City dịka nwunye nke abụọ
Wolves ezila Manchester City ihe ọkụ ji ntị oke eme site n'iji otu ọkpụ goolu merie ha n'asọmpi Premier League.
2019-10-06T15:22:31Z
Man City vs Wolves: Wolves akwụọla ụgwọ isi Man City dịka nwunye nke abụọ
Manchester City vs Wolves 'Ma nwata erughi eru wara ọgọdọ, ọgọdọ awụchie ya anya' bụ ihe Wolves mere Manchester City Wolves ji ọkpụ goolu abụọ chara acha tie Man City mmọnwụ n'ụlọ ha bụ 'Etihad Stadium'. Liverpool awụọla Man City n'ala Mmiri eriela Man City n'azụ ụlọ ha Otu egwu bọọlụ abụọ ndị a siri ọnwụ na onweghi onye ga-enye ibe ha goolu ruo ngwụcha ọkara mbụ n'asọmpi a. Mana n'ime ọkara nke abụọ dịka ọ fọrọ nkeji iri ka e gbuchie bọọlụ, Wolves nyụrụ nsị n'ụlọ Man City site n'inye ha goolu. Goolu mbụ a Wolves nyere si n'aka Adama Traore na nkeji 80. Dịka Man City ka na-esi ọnwụ ịsa otu goolu a, Adama Traore wụchasịrị ha goolu ọzọ n'isi n'ime nkeji 90. Ọdịda a Manchester City dara ji ọnụọgụgụ asatọ dọlaa ha azụ n'ịchukwute Liverpool bụ ndị mbụ na tebụlụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ọgọ ukwu ndị Igbo nwere na mba Pope Francis a ga-ekwe ka ndị 'Fada' bido lụwa nwaanyị? Etu ndị nkuzi Anambra si piachakọrọ nturugo nke onyeisiala
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Manchester City", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-49954271
Newcastle echiela Man United 'E cheta ebewe nke mbụ n'Ịngland'
Newcastle United agbawala Manchester United obi n'iji otu ọkpụ goolu merie ha n'asọmpi Premier League.
2019-10-06T17:47:58Z
Newcastle vs Man United: E chiela Man United 'E cheta ebewe nke mbụ n'Ịngland'
Newcastle na Manchester United 'Aga m akọrọ onye akwa ụwa m' bụ akwa Manchester United bere mgbe Newcastle United meriri ha n'asọmpi Premier League. Mmeri a bụ ihe mgbawa obi nye Man United n'ihi otu goolu Newcatle nyere ha bịara na ngwụcha oge. Everton abọkasịala Man United ka ọkụkọ 'Easter' Crystal palace anyakasịala Man Utd ka gwongworo ike ụwa gwụrụ Wolves akwụọla ụgwọ isi Man City dịka nwunye nke abụọ Otu egwuregwu bọọlụ abụọ ndị a foro ntụtụ taa n'ime ọkara mbụ n'asọmpi ahụ. Mana goolu a si n'aka Mathew Longstaff dị afọ iri na itoolu nke Newcatle bịara na nkeji 72 n'ime ọkara abụọ. Man United siri ọnwụ etu ha nwere ike iji mere onwe ha aha mana Newcastle kwechiri ruo ngwụcha asọmpi. Nke a na-abụ ugboro atọ a na-emeri Manchester United n'afọ 2019 banye 2020 na Premier League. Otu ọkpụ goolu a e ji merie Man United dosara ha n'ogogo iri na abụọ na tebụlụ asọmpi Premier League. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Wolves akwụọla ụgwọ isi Man City dịka nwunye nke abụọ Brighton asapụla Tottenham ọcha ka azụ ite Ọgọ ukwu ndị Igbo nwere na mba
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Manchester United", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49950469
'Lamborghini' Mercy abụrụla Ugoeze Big Brother Naija
Mercy emeriela n'asọmpi ime ụlọ Big Brother Naija maburu nde naịra 60 larie.
2019-10-06T18:28:35Z
Big Brother Naija: Lamborghini Mercy abụrụla Ugoeze Big Brother Naija
Akụkọ dị mkpa: Mercy Eke bụ nwaanyị mbụ na-emeri BigBrother Naija N'ikpeazụ 'Lamborghini' Mercy atụrụla ugo dịka Ugoeze n'ihe emume onyonyo nke Big Brother Naija. Dịka ọgụ, mgba, oge ịhụnanya nakwa esemokwu mere n'ime ọnwa atọ gara aga, Mercy meriri Mike iji bulie agbaego a na-ala. Tacha atachaala ụkwa jaa eze na Big Brother Naija Mpị Tasha na Mercy sụrụ n'ụlọ Big Brother Naija bụzi okwu akpụ n'ọnụ A chụpụrụ Frood, Seyi na Omashola n'emume n'abalị ụbọchị ụka tupu a kpọpụta aha Mercy. Cheta na ihe emume a ji mmadụ iri na ise malite n'ụbọchị 30 Juun, afọ 2019 rue taa otu onye pụtara dịka ọkaibe. Kwado nụ onye Igbo ịbụ onyeisiala n'afọ 2023 Ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo ekwuola na ọ dị mfe onye Igbo ịbụ onyeisiala n'afọ 2023 karịa inweta Biafra. N'ime akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ Okechukwu Isiguzoro na odeakwụkwọ ha bụ Okwu Nnabuike wepụtara, otu a kpọrọ okuka ndị Ipob nakwa ndị Igbo niile gbakọta aka iji họpụta nwafọ Igbo dịka onyeisiala. Akụkọ dị mkpa: Igbo nwe onyeisiala na 2023 - APC Ndị Igbo jiri biri asaala Junaid Mohammed banyere ọkwa onyeisiala 2023 Otu gara n'ihu kwuo na ha ga-enye ndị mpaghara ndị ọzọ ngarị iji mee ka ha dọnyere ndị Igbo ukwu ịhọpụta onyeisiala. Ohanaeze Ndigbo kwuru na ha ga-arịọkwa otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka ha họpụta onye Igbo ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisiala. Gọọmentị akwụwala ụgwọ ọnwa opekatampe - Ngige Ngige so na Kọmiti na-ahụ maka ibuli ụgwọọnwa Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na gọọmentị etiti amalitela ịkwụ ndị ọrụ ogodo ha kachasị nta ụgwọ ọnwa opekatampe puku naịra atọ. Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị na otu jikọtara ndị ọrụ ka na-arọzi olu maka nke ndị ọrụ nọ n'ogogo dị elu. N'ofesi Otu nwoke ji egbe agbagbuola mmadụ anọ ma merụọ mmadụ ise ahụ n'otu ụlọ a na-aṅụ mmanya n'obodo Kansas dị n'Amerịka. Ndị uweojii gwara ndị ntaakụkọ BBC na nwoke na-asụ asụsụ ndị Spen riri mbọ mbọ ọsọ ngwa ngwa ọ gbachara arụ a. N'egwuregwu Wolverhampton Wanderers ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu lụọ ndị Manchester City dịka nwụnye n'asọmpi Premier League. Chelsea ji ọkpụ anọ asatara otu tie Southampton mmọnwụ ebe Arsenal ji otu ọkpụ merie Bournemouth. Nkeji Ihe nkiri Gọvanọ Borno akpọla ndị nsọ ga-eji ekpere chụpụ Boko Haram Lafia Dole bụ aha agha ebidoro ibuso Boko Haram kamgbe afọ 2015. Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Zulum ahọpụtala ndị ekpere 30 bụ ndị ọ sị na ha ga-aga ala nsọ bụ ebe ha ga-eje kpọpee ekpere dị ekwụ bụ nke ga-ememila Boko Haram na steeti ahụ na ndị nọ ya nso bụ ebe ọrịa Boko Haram ji aka. Nke a si na ọnụ onye na-ekwuchitere ya bụ Gọvanọ bụ Isa Gusau bụ onye kwuru na ndị ekpere iri atọ a adịla njikere ị ga ala nsọ ha na Saụdị Arebia bụ ebe ha ga-anọ kpọpee ekpere ga-ememila ndị omekaome a. Boko Haram awakpoola Maiduguri ọzọ Egbuola ndị Boko Haram 5 na Sambisa Kedụ isi ụka Naijiria na Boko Haram? Gusau kwuru ụbọchị Satọde na " Gọvanọ Babagana Umara Zulum na ndị ekpere iri atọ bị na Makkah enweela nkwekọrịta maka ị kpe "Dawaf' kwa ụbọchị maka ịmemila Boko Haram na steeti ndị ọmetutara". O kwughị ma ego eso na ya bụ nkwekọrịta mana ọ sị na ndị ekpere a sị Borno, Katsina, Zamfara nakwa Kano steeti. O kwukwara na ndị nsọ a bụ ndị tagoro ọjị ụwa n'ekpere bụ ndị nọgoro ihe ruru afọ iri anọ na Ka'aba bụ ụlọnsọ ha na-efe Chukwu. Ka'aba bụ ebe kacha nsọ na Al-Haram Mọsk dị na Makkah. Gusau sị na ekpere ndị a ga-enyere ndị agha aka imeri Boko Haram kpamkpam ma wetakwa udo tọrọatọ na Steeti ha. Isreal Adesanya eturula ụgọ UFC243 middleweight Isreal Adesanya eturula ugo UFC middleweight Isreal Adesanya nwaafọ Naịjirịa nke a na-etu "Last Stylebender" akụpụla Robert Whittaker mkpụrụ ọkwụrụ n'anya maburu mbenaukwu nturugo nke UFC middleweight championship nke na-akpọtụ na ọgbọọgụ Melbourne, Australia. Adesanya ji iwe kụpụ Whittaker anwuru n'anya nke Bekee kpọrọ "knockout" n'agba nke abụọ. Ọ kpara ike a site na ịkụ ya ọkpụ 3:33 bụ ebe ọ nọ menye ya bụ nwoke ihere n'ihu mmadụ puku iri ise na asaa. Mmeri a mere ka ọ rigoro na ogoogo 18-0 bụ nke mere o jiri bụru ọkaibe na ya bụ "middleweight" Adesanya gwara Jon Aik bụ onye nkọwa nke ọkpa ahụ " ọbara gbaburu m n'ime, ụgbụa nke ya agbawala ya". Nwafọ Naịjirịa bụ onye na-anọchite mba New Zealand bụzị onye ji mbenukwu nke "middleweight title" na egwuregwu UFC 243. Ọsọ tara na mmeme BBC 1 Extra na Birmingham Arena Obi ọjọọ ji ndị mmadụ ụnyahu bụ Satọde ka ndị amakekwu tisara mmeme ndị BBC 1 Extra kpokobara na Birmingham Arena. Ya bụ ahịa họrọ onyeukwu na onyenta ebe ihe ruru mmadụ 15,800 kwuru ụkwọ ya bụ mmeme gbara aka lawa na-ekirighị ihe ha jiri bịa. BBC 1 Extra buputara egwu ndị ọhụrụ nakwa nke dị ochiedike dị n'egwu bụ nke azụchara oche niile dị n'Arena. Mmadụ dịka Aitch, French Montana, Ms Banks, Wizkid na ndị ọzọ bụ ndị buputara egwu ha ọgbọ. Mana ọrụ kụrụ akụ. Otu onye n'ime ndị BBC kpọrọ bịa ya bụ egwu bụ onye ọmambem Bekee akpọrọ Krept bụ onye asị na-akụrụ ihe na ya bụ emume eji kagbuo ya. Akụrụ Krept ihe na mmeme BBC 1 extra ụbọchị Satọde Ya bụ nwaadị gbara afọ 23 azaala n'akara Twitter ya na ya enweghị nsogbụ ọbụla. Dịka ndị uweojii na-ama ime n'ala ka ha chọpụta nke bụ eziokwu na ndị mere ya bụ ihe, ha sị na ya bụ nwaamadị emerughị ahụ ọbụla. Ala ọmajiji n'Alayi Ndị Isiaku Alayi dị na Okpuruọchịchị Bende nke Abịa steeti chizi obi na aka dịka alaọmajijii mebichara ugbo na ụzọ ha. Eze Uche Akukwu nke mbu na Alayi akpọkuola Gọọmenti ukwu ma nke nta ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka maka ụganị nke nwere ike ịdakwasị ha maka ọdachi a. TUC amala ọkwa abụbụ ọrụ Ndị Naịjirịa kee nkwụcha chebiri abụbụ ọrụ kacha abụbụọrụ site n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Ọktoba. Onyeisi ndị Trade Union Congress bụ Quadri Olaleye kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti etiti elebeghị anya na ibuli ụgwọ ọnwa ndị isiọrụ bụ nke ha bidoro ịgba ụgwọ ya kemgbe na egwu ga adị. O gbugbu mmadụ na mmeru ahụ a ezuolanụ! Otu na ndị isi United Nations bụ Jeanine Hennis-Plasschaert tiri mkpu maka otu narị mmadụ egbugoro na mba Iran site na ngagharịiwe amalitere kemgbe izuuka. Ndị Iran na-eme ngagharịwe maka agụ, enweghị ọrụ na mpụ ha sị na ọ ka nkụ na obodo ha. Arsenal na Bournemouth N'egwuregwu, taa bụ oke ụbọchị na Premịa Lig dịka Arsenal ga-ezute Bournemouth, Man City na Wolves ga-ezute onwe ha. Southampton na Chelsea ga-akwata ebe New Castle na Manchester United ga-ama ọkaibe. Gee akụkọ anyị n'otu Nkeji Akụkọ ga-amasị gị Ụmụakwụkwọ Chibok anọọla ụbọchị 2000 n'aka Boko Haram Brighton asapụla Tottenham ọcha ka azụ ite A gaghị arịọ Tammy Abraham na Fikayo Tomori arịọ ịgbara Naịjirịa bọọlụ - Kanu Nwankwo
[ "Gburugburu", "Enyem aka mba ụwa", "Naijiria", "Egwuruegwu", "Iran", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Klaimet chanji" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49955737
Onye nkuzi Unilag na-enye ụmụakwụkwọ nsogbu iji dinaa ha amala n'ọnya
Ndị nkuzi inye ụmụakwụkwọ nsogbu iji dinaa ha abụzighị ihe ọhụrụ na mahadum, mana nke a bụ ihe jọgburu onwe ya.
2019-10-07T04:15:01Z
Sex for Grades: Onye nkuzi Unilag na-enye ụmụakwụkwọ nsogbu iji dinaa ha amala n'ọnya
Ugboro ugboro ka ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị na mahadum dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka na-ekwu na ndi nkuzi ha na-enye ha nsogbu iji dinaa ha. Mana mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị ekwetacha ihe ha na-ekwu. BBC 'Africa Eye' mere nnyocha pụrụ iche iji mata ma ihe dị otu a ọ na-eme n'ezie. Ihe anyị hụrụ juru anyị anya, dịka ị ga-ahụ n'ihe onyoonyoo ahụ dị n'elu. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
[ "Legọsị", "Naijiria", "Mpụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49937038
Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti
N'Anambra ka e nwere ahịa kacha ibe ya na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka, mana ọbụghị sọ nke a bụ ihe ha ji anya isi.
2019-10-07T08:10:35Z
Anambra State: Ihe akụ ọnatarachi juru na steeti a
Ụmị mmanụ agbidi Ụmị mmanụ agbidi Ahịa otu nkwọ Ọnịcha n'Anambra Steeti bụ ahịa kacha ukwu na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka niile. Nke a mere na e kwuo okwu ịzụ ahịa na Naịjirịa, a ga-akpọrịrị Anambra. Nke a pụtara na-achụcha ya bụ aja ma ahụghị udele, mara na ihe mere be ndị mmụọ. Agbara nwaanyị ndị si Anambra state Nigeria enweghi ike ichefu A mabeghi ndị wakporo ụlọụka n'Aguleri - Uweojii Aka Willie Obiano adịghị n'ịhọpụta Eze ọhụrụ Aguleri Mana ọbụghị sọ ahịa ka steeti a ji dị ebube. Ha nwekwara ihe akụ ọnatarachi dị icheiche juputara n'ala ha. Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a dịka ụlọọrụ 'Raw Materials Research & Development Council' si depụta: 1) Mmanụ agbidi Ụmị mmanụ agbidi Agbanyeghi na Anambra esoghi na steeti ndị a ma ama na Naịjiria na-emepụta mmanụ ala, nke ahụ apụtaghị na ha enweghị mmanụ n'uju. Okpuru ọchịchị Anambra, Mbamili nakwa Ogbaru nwere mmanụ ala nke ọma. Gaasị dịkwa na mpaghara ndị ahụ n'uju. 2) Kaolin 'Kaolin' 'Kaolin' bụ ụdị nkume pụrụiche e nwere ike iji mee 'Ceramics', maọbụ werekwa ya rụọ ọgwụ. E jikwa 'Kaolin' arụpụta ude na-edozi anụ ahụ nakwa ihe e ji eme ka eze na-egbuke ọcha. Dịka webụsaịtị 'statista.cọm' si depụta, a na-ere 'Kaolin' $140 maka otu tọn. Mpaghara Aguata, Ayamelum, Ihiala, Njikoka na Nnewi, nwere Kaolin n'ala ha. 3) Pyrite Pyrite 'Pyrite' bụ ụdị igwe (metal) pụrụiche na-egbuke egbuke e si n'ala egwupụta. A na-eche na ebe ọbụla a hụrụ 'Pyrite', ọlaedo nwere ike ịdị n'okirikiri ahụ. 'Pyrite' na-enwekwa ajịrịja ọlaedo n'ime ya nke bụ na a gbarie ya, e nwere ike ịnweta kịrịkịrị ọlaedo. A na-ejikarị ya emepụta mgbaolu, mgbaaka, nakwa ọla ndị ọzọ e ji eji ejiji. Mana ọ galaghị oke ọnụ dị ka ọlaedo. Ị ga-ahụ 'Pyrite na mpaghara Ọnịcha Nọt na Ọnịcha Saụt nakwa Oyi. 4) Lignite 'Lignite' bụ ihe dịka unyi (coal) Ọ na-esi n'osisi kpọnwụrụ akpọnwụ nke relara n'ala puku kwuru puku afọ gara aga apụta. A na-akpọkwa 'Lignite' 'Brown Coal' maọbụ 'Brown Diamond'. E nwere ike iji 'Lignite' emepụta ọkụ latrik. Kama ndị ọkacha mara kwuru na 'Lignite' adịghị mma maka na ọ na-ebute mgbanwe ihu eligwe nke a kpọrọ 'climate change'. Ọkụ latrik e ji ya mepụta na-aka adị ọnụ ala karịa nke e ji 'coal' maọbụ gaasị mepụta. Lignite dị na mpaghara Idemili West, Nnewi North nakwa Ọnịcha Not na Saụt. 5) Sand stone Sand stone 'Sand stone' bụ ụdị okwute si n'aja ọcha apụta. Okwute a na-egbuke egbuke ma makwaa mma ile anya. Mana o sichaghị ike dị ka nkume ndị ọzọ. Ya mere a na-eji ya edozi ahụ ụlọ maọbụ achọ ya mma. I gaa na akụkụ Aguata ụfọdụ, Aniocha, Idemili, ị ga-ahụ 'Sand stone' nke ọma. Ọ dịkwa na akụkụ ụfọdụ n'Ọnịcha nakwa Oyi. 6) Lateritic Clay Nke a bụ aja ụpa pụrụ iche E ji ya arụ ihe dị icheiche dịka ụzọ nakwa akụrụngwa ndịọzọ e ji arụ ụlọ. A na-ahụ aja ụpa a n'ọkụ iji mee ka ọ kpọọ nkụ ma sie ezigbo ike tupu ewere ya rụpụtawa ihe dị icheiche. 'Laterite' bara ụba n'okpuru ọchchị Orumba Nọt na Saụt. 7) Iron Stone 'Iron Stone bụ ụdị nkume pụrụiche. Ọ na-enwetụ kịrịrị igwe n'ime ya. Ụfọdụ na-enwekwa kịrịkịrị ọlaedo n'ime ha. Ihe ejikarị ya eme bụ ịgbari ya iji nweta igwe maọbụ ọlaedo dị n'ime ya. E jikwa ya arụ ụlọ. Mana ọbụchaghị okwute dara oke ọnụ ahịa. Ebe ụdị nkume a dị bụ n'akụkụ ụfọdụ n'okpuruọchịchị Anambra East nakwa Orumba Nọt na Saụt. Ihe akụ ndị a nwere ike ime ka nnweta ego bawanye na Anambra ma ọ bụrụ na gọọmentị steeti ahụ na gọọmentị etiti jikọọ aka ọnụ. Anambra nwekwara ala na-amịpụta nrị nke ọma, na-agbanyeghị na mbuze na-enye nsogbu ebe ahụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Lee ọtụtụ ihe akụ ọnatarachi juputara n'Abia State nke nwere ike ime ha ọgaranya Lee etu Nigeria na mba Africa ndị ọzọ nweere onwe ha na 1960 si kwụrụ Kedụ ndị bụ "Ụmụada" n'ala Igbo? Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Anambra Steeti", "Akụ na ụba", "Ahịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49957918
Chimamanda Adichie bụ onye nke anọ olu ya ka ada ụda n'Afrịka
Chimamanda Adichie bụ naaị nwanyị aha ya dị n'aha mmadụ iri ndị a kacha anụ olu ha n'Afrịka.
2019-10-07T10:11:16Z
Chimamanda Adichie bụ onye nke anọ olu ya ka ada ụda n'Afrịka
Chimamanda Adichie Chimamanda Adichie Ada Igbo a ma ama bụ Chimamanda Ngozi Adichie bụ onye nke anọ na ndị kacha nwee agba n'Afrịka niile. Nke a bụ dịka akwụkwọ akụkọ 'The Africa Report' si depụta. Ihe iri ị kwesịrị ịma maka ada Igbo bụ Chimamanda Adichie Agbara nwaanyị ndị si Anambra state Nigeria enweghi ike ichefu Akwụkwọ a deturu aha mmadụ otu narị bụ ndị ha sị na okwu ha na-ada ụda n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, iji ego achụ ego, nakwa nka. Naanị Adichie bụ nwanyị aha ya dị na aha iri e bu ụzọ depụta na ya bụ akụkọ bụ ndị Afrịka ji biri. Onye nke mbụ aha ya gbara n'akụkọ ahụ bụ Aliko Dangote, nwaafọ Naịjirịa kacha baa ọgaranya n'Afrịka niile. Ndị ọzọ bụ Elon Musk, Koos Bekker nakwa Trevor Noah ndị mba Saụt Afrịka. Adichie bụ nwaafọ Igbo e ji ide akwụkwọ mara. Ihe ọzọkwa e ji mara ya bụ ịkwalite ikike ụmụnwanyị. Adichie deela ọtụtụ akwụkwọ ma nyekwa ọtụtụ nkuzi n'ebe dị icheiche gbasara ụmụnwanyị, Naịjiria nakwa Afrịka. Ọ bụkwa onye ihe gbasara asụsụ na omenala Igbo na-anụ ọkụ n'obi mgbe niile. Nkịtị nkịtị azụọla n'ahịa udele! Ọka mmụta Boniface Igbenehue BBC Afrịca Eye anwụdela onye nkuzi mahadum Legọz ahụ na-atọ bịrịbịrị, na-anaghị ekwe ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Ugboro ugboro ka ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị na mahadum na-ekwu na ndi nkuzi ha na-enye ha nsogbu iji dinaa ha. Mana mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị ekwetacha ihe ha na-ekwu Mana aka akparala ezekudele, ọ ga-ekwuzi mmụọ chiri ya ọzọ. Ụmụakwụkwọ a tọọrọ na Kaduna A ka na-achọ ụmụakwụkwọ sekọndịrị nke Engravers College na Kaduna bụ nke ndị ntọrị nwụụrụ kamgbe abali anọ gara aga. Akụkọ na-ekwu na ndị ntọrị ahụ na-akpọ aha ego iji hapụ ụmụakwụkwọ ahụ mana ndị uweojii Kaduna steeti sị na ha na-anwa oke ha ịchọta ha. Cheta na ndị ntọrị wakporo ụlọakwụkwọ ahụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Tọọzde, abalị atọ nke ọnwa Ọktoba, ma tọrọ ụmụakwụkwọ isii na ndị nkuzi abụọ. Gọọmentị Kaduna kwekwara nkwa na ha ga-eme ihe niile ha nwere ike ịchọta ndị ahụ a tọọrọ. Ihe mgbu Trump abawanyela Onyeisiala mba Yukren Volodymyr Zelensky na onyeisiala mba Amerịka Donald Trump Okwu gbasara nchutu onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-arịwanye elu gbasara mkparịtaụka ya na onyeisiala mba Ukraine nwere n'ekwe ntị oge gara aga. Ugbua, ha adịla mmadụ abụọ bụ ndị na-ebo Trump ebubo agwa ọjọ gbasara ya bụ mkparịtaụka. Mana Trump ka na-esi ọnwụ na onweghị ihe ọjọọ o mere. Ese Brume emechapụtala Naịjirịa ihu Ndị mmadụ ka kpụ Mercy n'ọnụ n'ihi mmeri o meriri n'ihe omume Big Brother Naija, mana ihe ukwu mekwara na Doha na mba Qatar. Ese Brume, riteere Naịjiria ola mbụ nke egwuregwu 'athletics championship' bịara n'isi njedebe ụnyaahụ mgbe o nwetara ọla nchara n'asọmpi 'Long jump'. Nke a bụ naanị otu ọla Naịjirịa nwatara na ya bụ egwuregwu 'International Association of Athletics Federations' IAAF. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: 'Lamborghini' Mercy abụrụla Ugoeze Big Brother Naija Ọgọ ukwu ndị Igbo nwere na mba Pope Francis a ga-ekwe ka ndị 'Fada' bido lụwa nwaanyị? Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria", "Egwuruegwu", "Donald Trump", "Amerika", "Ikike ụmụnwanyị", "Afịrịka", "Legọsị steeti", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49963289
Otu ọhụrụ a kpọrọ CONUA esila na ASUU kewapụ onwe ha
Otu ahu kwuru na ọmasịghị ha etu ndị Asuu si agba arụkwaghị m oge ọbụla.
2019-10-07T13:32:18Z
Asuu Faction: Otu ọhụrụ a kpọrọ CONUA esila na ASUU kewapụ onwe ha
Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige na Onyeisi ndị Asuu bụ Biodun Ogunyemi Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige na Onyeisi ndị Asuu bụ Biodun Ogunyemi na onye ọzọ. Otu ọhụrụ a kpọrọ 'Congress of University Academics' maọbụ CONUA n'aha ịchafụ esila na otu ndị nkuzi mahadum bụ 'Academic Staff Union of Universities' kewapụ onwe ha. Otu a kwuru na iwe ha bụ nkụsasị nke Asuu na-akụsasị usoro oge agụmakwụkwọ na Naịjirịa n'ihi oke ịgba arụkwaghịm. 208bn TETFund: ASUU ọ ga-agba abụbụọrụ ọzọ? Abụbọ ọrụ ASUU abịala na njedebe Onye isi otu a bụ Niyi Sumonu gwara BBC na ha na-agba mbọ ugbua idebanye aha otu ọhụrụ ha ka o wee tozuo etozu na Naịjirịa. Dika Sumonu si kwuo ihe kpatara ha ji kewapụ bụ: 1) Iji mee ka e nwee otu ọzọ ga akwudoro ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi na mahadum. 2) Iji weta ụzọ ọzọ e nwere ike isi mezie esemokwu dị n'etiti gọọmentị na ndị nkuzi. ASUU strike: Kedụ mgbe ọ ga-ebi? Sumonu kwuru na ọdịghị mma etu Asuu na-esi agba arụkwaghịm maka obere okwu ọbụla dapụtara n'etiti ha na gọọmentị. O kwuru na nke a na-ebute nghasa n'usoro agụmakwụkwọ na Naịjiria. Na nzuko izizi nke Conua nwere n'ụbọchị Satọdee, ndị biara nzukọ ahụ bụ ndị nkuzi Obafemi Awolowo University Ile-Ife; Federal University, Lokoja, Kogi State na Kwara State University. Ndị ọzọ bụ ndị Ambrose Ali University Expoma, Edo State nakwa Federal University, Oye-Ekiti. Mana Sumonu kwuru na ọtụtụ ndị nkuzi si ụlọakwụkwọ ndị ọzọ egosila mmasị isonye n'otu ọhụrụ ha. Akụkọ kwuru na onyeisi Asuu bụ Biodun Ogumyemi sị na ya amaghị maka ndị otu ahụ kewapụrụ ohụrụ. Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ya n'igwe, ọ rịọrọ ka e zitere ya ozi 'SMS' n'ihi na ọ nọ na-nzukọ. Mana ọ zghachibeghị ozi anyi zigaara ya ruo mgbe anyị wepụrụ akụkọ a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti Lee ihe ndị nkuzi Unilag na-ekwu maka onye nkuzi na-edina ụmụakwụkwọ enwudere n'igwe ose foto Chimamanda Adichie bụ onye nke anọ olu ya ka ada ụda n'Afrịka Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "International Labour Organization", "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49966977
Bukola Saraki akpọọla oku ka gọọmenti bulite "sexual harassment bill" ọzọ
Ndị ọnụ na-eru n'okwu etinyela ọnụ n'ọkwụ gbasara mmerụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyi nke ihe nkiri BBC Africa Eye gosiri.
2019-10-07T18:16:14Z
Sexual harassment bill: Bukola Saraki akpọọla oku ka gọọmenti bulite ya ọzọ
Bukola Saraki N'otu aka ahụ onye bụbu onyeisi na ụlọomeiwu Naịjirịa ukwu bụ Bukola Saraki arịọla Onyeisiala Muhammadu Buharị na ndị omeiwu ka ha lebeanya n' iwu gbasara ndị nkuzi na-emerụ ụmụakwọkwọ nke ha malitere n'ọchịchị ya. Saraki kpọro ọkụ a ka o kirichara ihe nkiri nke BBC Africa Eye mere gbasara ndị nkụzi na-emebi ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyi site na ịna ha ahụ ha ka ha were lafere n'uleakwụkwọ. Iwu ahụ emechabeghị nyere mkpọrọ afọ ise maka onye nkụzi ọbụla mere nke a. Foursquare Church eyipula Boniface uwe Dịka ụzụ na-atụ maka onye nkuzi Unilag bụ Boniface Igbeneghu emume BBC agbara na-anwụ maka imebi ụmụagbọghọ, ozi na-eru anyi nti bụ na ụka ya bụ Foursquare Gospel Church eyipụla ya uwe nsọ ya. N'otuaka ahụ Ụlọakwụkwọ Unilag sị na ha anapụla ya bụ nwaadị ọrụ ya nwamgbenta. Ransford Gyampo na-aba mba Ka ọ na-akpọtụ na Naịjirịa bụ ka ọ na-akpọtụ na mba Ghana ebe onye nkụzị ya bụ ihe nkiri BBC gbara na-anwụ na-agọ ụkwụ na aka. Ransford Edward Gyampo ekwuola na ya ga-akpọpụ BBC Afrịka Eye ụlọikpe maka ịhe nkiri ahụ gbara ya n'anwụ. David de Gea ekwuola hoo haa David De Gea bụ golii ndị Manchester United N'egwuregwu, onye na-echere Manchester United goolu bụ David de Gea ekwuola nke bụ eziokwu maka ọnyụpa ndị otu ya na agba n'ọgbọ a. Gea sị na ọgbọ a kacha njọ kemgbe afọ iri atọ nke otu egwubọọlụ ahụ bụ nke ọ sị na ya ahụbeghị Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti Otu ọhụrụ a kpọrọ CONUA esila na ASUU kewapụ onwe ha Chimamanda Adichie bụ onye nke anọ olu ya ka ada ụda n'Afrịka
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ịwakpo mmadu na-ike", "Ghana" ]
https://www.bbc.com/igbo/49966978
Gọọmentị Abịa state ehibela kọmitii ga-etinye anya n'ọkụ gbara n'Aba
Gọọmenti Abia state chọrọ ịlebe anya n'ihe butere ọkụ gbara n'Aba.
2019-10-07T19:51:25Z
Aba fire disaster: Gọọmentị Abịa state ehibela kọmitii ga-etinye anya n'ọkụ gbara n'Aba
Ọkụ gbara Aba Gọọmenti Abia Steeti ehibela kọmitii ga-enyoba anya n'ọkụ gbara n' Umuosi, Degema na Anaba street n'Aba, Abia steeti n'ụbọchi iri abụọ na asaa nke ọnwa September 2019. Gọvanọ Okezie Ikpeazu enyela iwu ka kọmitii a tinye anya ma chọpụta ihe kpatara ya bụ ọkụ gbara ụlọ asatọ na ogbe ahụ. Ndị Aba ebola ndịagha Naịjirịa ebubo mkpagbu Ndị Aba na-arụzị akpati ntuliaka Ụtụ anwụrụ na mmanya etinyela ego Ha ga-achọpụtakwa egoole ụlọ na ngwongwo ndị mmadụ ọkụ gbara pụtara. Kọmitii a ga-etinye anya na mmiri chọpụta ndị kpara ya bụ arụ ka e were kpụpụ ha ụlọikpe ma maa ha ikpe ka okwesiri. Dịka John Okeiyi bụ Komishona mgbasa ozi dị n'aka si depụta, ndị nọ na kọmitii a bụ: 1. Chief (Dr) Ukpai Agwu Ukpai (Onyeisi) 2. Mr Sopuruchi Ernest Beke (SOP) (Onye otu) 3. HRH Eze Sunday Emejiaka (Onye otu) 4. Dr NCNC Okoli (Onye otu) 5. Rev. (Dr) Ogboso Ejindu (Odeakwụkwọ) Enyere kọmitii a izuụka abụọ ịme nchọpụta ndị a ma degara Gọvanọ akwụkwọ maka nke a. N'aka ọzọ, otu na-ahụ maka mekọrịta ndị agha na ndị mmadụ bụ nke na-anọghị n'okpuru gọọmenti gara njem nleta na ebe ya bụ ọkụ mebiri ihe. Nelson Nwafor onyeisi ndị otu na ahụ maka mmekọrịta ndị agha na ndị nkiti Dịka onye ndu ha bụ Comerade Nelson Nwafor si kwuo, "Ihe anyị huru ebe ahụ na-agba anya mmiri". Nwafor sị na ndị otu ha gbara mmadụ iri na anọ ajụjọ ọnụ n'ebe ahụ. Ha sị na onu mmadụ niile ahụ dakọrọ na-ịkagbụ agwa ndị uweojii bụ ndị ha na-ebo ebubo okụ ahụ. Ndị uweojii agọkwaala ụkwụ na aka ebe ha hibekwara kọmitii nchọpụta nke ha. Ndị otu a sịkwa na ogbe ahụ ka dịkwa ka ebe ọsọ gbara maka ndị uweojii na-abịa ebe ahụ akpara ndị mmadụ. Lee ihe nkiri a Akụkọ ga-amasị gị Otu ọhụrụ a kpọrọ CONUA esila na ASUU kewapụ onwe ha Bukola Saraki akpọọla oku ka gọọmenti bulite "sexual harassment bill" ọzọ Chimamanda Adichie bụ onye nke anọ olu ya ka ada ụda n'Afrịka
[ "Naijiria", "Abia Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-49966980
'Ihe m kwuru e kwuola m ya, Senate na-emefu nnukwu ego' - Rochas Okorocha
Rochas Okorocha bụ Sịnetọ na-anọchite anya mpaghara Imo West sị na gọọmenti na-emefu oke ego na ndọrọndọrọ ọchịchị.
2019-10-08T03:57:05Z
Rochas Okorocha: Sineti na-emefu nnukwu ego na ekwesighi ekwesi
Okorocha chọro ka e weleta mmadụ ole ndị na-aga ụlọ nnọchiteanya n'ụlọomeiwu. N'uche ya, "o nweghị ihe mmadụ atọ mere n'ụlọomeiwu otu onye agaghị emeli". Okorocha sị na a sị ya pụọ na ya bụ ụlọomeiwu ka Naịjirịa dị mma, na ya ga-apụ. O kwukwara na ọ dịmkpa ka Naịjirịa tiny uche na ịchọwa ụzọ ọzọ ha ga-esi kpata ego na abụghị mmanụ agbidi.
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49956827
Kedụ ka ndị meriri 'Big Brother' mbụ si eme ụgbụ a?
Kedu ka ndị meriri emume 'Big Brother' si eme ụgbụ a.
2019-10-08T08:53:50Z
Big Brother Naija: Kedu ihe ndị meriri 'Big Brother ' mbụ ji ndu ha eme ụgbu a.
Efe Ejeba Efe Ejeba banyere iti egwu dịka o siri kwuo mgbe ọ mechara BBNaija. Dịka Mercy Eke (Lambo )ritere ihe ruru nde naira iri na isii n'emume Big Brother Naija nke 2019, anyi nyochara ndị ritere ụrụ na mmerị Big Brother na mbụ etu ha si eme ugbua. Ihe emume Big Brother Naija bụ ihe na-amasị ndi Naijiria ma ndị ntoroọbịa ma ndị okenye. O bidoro n'afọ 2006 na Naijirịa ma bụru kwa emume na-ewu ewu mgbe ọbụla emere ya. 'Lamborghini' Mercy abụrụla Ugoeze Big Brother Naija Ọtụtụ mmadụ merurụ ahụ nhọpụta Big Brother Naija Gụo akụko ka i mata mbọ ụfọdụ ha na-agba ụgbụa. Efe Ejeba Efe Ejeba onye eji 'Based on Logistics" mara meriri emume BBNaija nke 2017. Efe bụ onye Delta steeti ma bụrụ kwa otiegwu. Na agbanyeghị na o nwere asambodo 'Economics', ọ bụ iti egwu marịri ya. E nyela Khafi ọsọ n'ụlọ Big Brother Naịja Mpị Tasha na Mercy sụrụ n'ụlọ Big Brother Naija bụzi okwu akpụ n'ọnụ Kemgbe ọ pụtara n'ụlo 'Big Brother', Efe na enyere aka n'ihe gbasara agụm akwụkwụ ọkachasị na Jọs ebe onyere ụmụ akwụkwọ oche na ihe ndị ọzọ. Efe na enyere aka n'ihe gbara agụmakwụkwọ O tipụtala egwu dị iche iche ma nke ọhụru ya na Ice prince tiri na nso nso a. Ejegba ka na arụ kwa ọrụ onye obi ọma ma o tinyekwara ego ya dịka onye oji ego achụ ego n'ihe dịka Teknụzụ, Agụmakwụkwọ na Ime njem. ma na agbape ebe esi enweta mmiri 9Bore Hole) n'ebe dị iche iche. Miracle Ikechukwu Igbokwe Miracle bụzi ọkwọ ụgbọelu Miracle bụ nwa afọ owerre Imo state bụ kwa onye ọkwọ ụgbọelu. O merịrị BBNaija (Double Wahala) n'afọ 2018. Nwaafọ Igbo emeriela Big Brother Naija 'Aka anyị adịghi na ihe nkiri Kaffy na-eme' - Uweojii Ingland Ihe oritere bụ ego na ngwa rụrụ nde Naịra iri anọ na ise. Miracle kwuru na ọ ga alahachị ọmụmụ i bụ onye ọkwa ụgbọelu. Ka ọ dị ụgbụa, Ikechukwu Igbokwe abụrụla nke ndị ọkwo ụgbọelu na-akpọ "Instrument Rated". Uti Nwachukwu Uti na eme ihe ejiji ụgbụ a. Uti nwachukwu turu ugo na Big Brother Africa nke afọ 2010 nka akporo 'All Stars'. O ritere ihe ga-abụ nde naịra iri asaa na abụọ na nari puku anọ ma agbanwe ya n'ọnu ego ugbua. AMVCA 2018: Lee etu ndị Igbo si pụta n'ọgbọ Tacha atachaala ụkwa jaa eze na Big Brother Naija Nwachukwu bidoro ime ihe ejiji mgbe ọ mechara Big Brother Africa. O bidoro ime ihe ejiji n'afọ 2011 ma tụrụ ụgo n'ime ejiji na emume 'Golden Icons Academy Movie Awards (GIAMA)' n'afọ 2012 dịka onye kacha eme ihe ejiji. E mere emume a na mba Amerịka. Katung Aduwak Katung Aduwak bụ onye na-aghazị ihe ejiji. Katung Aduwak bụ onye mbụ meriri Big Brother Nigeria nke mbụ emere n'afọ 2006. O ritere ihe ga-abụ nde naịra iri atọ na isi, na puku narị abụọ ma agbanwe ya n'ọnụ ego ugbua. Lee ihe ndị Igbo na-eme emume BBNaijia bụbụ tupu ha esonye Ji na ọkụkọ, lee ụdịrị ihe ndị e ji eme nturugo na mahadum Naịjirịa Aduwak gara mba Amerịka ebe ọ mụrụ etu esi ahazị ihe ejiji. Ọ mechara lọta Naijirịa mgbe ọ gụchara were hazị ụfodụ ihe ejiji nke gụnyere 'Unwanted Guests' na 'Heavens Hell'. Karen Igbo Rakos Karen Igho Rakos bụ onye mbụ meriri 'Big Brother' dịka nwanyị Naịjirịa na kwa nwanyị mbụ n'Afrịka n'afọ 2011. O ritere ihe ga-abụ nde naịra iri asaa na abụọ na nari puku anọ ma agbanwe ya n'ọnu ego ugbua. O na-eme ihe ejiji nke gunyere 'Omo Ghetto', 'Keeping my man', 'Tinsel' na ndị ọzọ. Akụkọ ga-amasị gị 'Lamborghini' Mercy abụrụla Ugoeze Big Brother Naija Newcastle echiela Man United 'E cheta ebewe nke mbụ n'Ịngland' Ọgọ ukwu ndị Igbo nwere na mba Pope Francis a ga-ekwe ka ndị 'Fada' bido lụwa nwaanyị? Lee ihe nkiri ga-amasị gị
[ "Ihe nkiri" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49956832
'Onye nọchiri ụzọ Gọvanọ n'okporo ụzọ ga-anata ntaramahụhụ' - Umahi
Gọvanọ Ebonyi steeti ekwuola na ndị nchekwa ya nwere ikike igba onye ọbụla nọchịri ụgbọala ya egbe.
2019-10-08T13:56:57Z
Dave Umahi: 'Onye nọchiri ụgbọala m ụzọ ga-anata ntaramahụhụ'
Gọvanọ Dave Umahi 'Madụ ekwesighị imegide mmadụ ibe ya n'ụzọ ọbụla'- Umahi Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi ekwuola na ndị nchekwa ya nwere ikike igba onye ọbụla nọchiri ụgbọ ala ya n'okporo ụzọ egbe. O kwuputara nke a mgbe ya na ndị ụlọọrụ gọọmentị Ebonyi steeti nwere nzụkọ n'Abakiliki n'ụbọchị satụde. Ọ bụ eziokwu na Ebonyi esoghi na Biafra? E nyela Ebonyi Steeti ikike ịrụ ọdọụgbọelu nke ha Umahi jiri ohere a were kọwara ndị a etu ndị mmadụ siri gbochie ụgbọala ya igafe n'okporo ụzọ dị n'Ọnịcha. O kwuru sị na na-agbanyeghị ndị nchekwa ma ndị agha ha na ya so, ndị a achọghị ka ha gafee. Nke a mere ka Gọvanọ Umahi nye ndị nchekwa ya iwu ka ha nwuchie ndị niile nọchiri ya ụzọ. Ndị nchekwa nwere ikike igba onye nọchịri ụgbọala Gọvanọ egbe. O kwuru na ọtụtụ na ime ndị a gbara ọsọ ma na ọ dị kwa otu onye agha ha napụrụ egbe ya. Umahi kwuru na ndị nchekwa na ndị uweojii pụrụ iche na-agba mbo inwude ndị a niile. Kedụ ebe a ga-agba Egwu Eke nke 2019? Unu etigbula ndị unu kwesiri ịchekwa - Ndị Gọvanọ ọwụwaanywanwụ O kwukwara na mgbe a nwụdoro ha, na a ga-akpọta ha n'Ebonyi steeti ma tụo ha nga. Ọ bụ nke a mere ka Umahi si " imu anya abalị maka ikwa ozu ga akwụsị n' elekere iri nke abalị site ụgbụa gawa n'ihu". Gọvanọ Umahi kwukwara na mgbe ọzọ, ndị nchekwa ya pụrụiche nwere ikike igba onye ọbụla nọchịri ya ụzọ egbe n'ihi na iwu naijirịa kwadoro ya. O kwuru na-onye ga-anọfe elekere iri ga-enweta ikike sitere n'aka onyeisi okpouru ọchịchị ya kama ihe ọbụla mere ga-adị onye enyere ikike a n'isi. Ọ ga kwara n'ihu kwuo sị " A chọrọ m ka agbasaa ozi a nke ọma maka na nsogbu m abụghị maka onwe m, kama ọ bụ onye nkiti na-agara onwe ya ndị a nwere ike iwakpo". Lee akụkọ ga-amasi gị 'A ga m ahuta na ha nwetara ntaramahụhu ruru ha' - Aisha Buhari Kedụ ka ndị meriri 'Big Brother' mbụ si eme ụgbụ a? Buharị ga-ebupute akwụkwọ etu gọọmenti ga-esi mefu ego n'afọ na-abịanụ 'Otụtụ ndị nkuzi Unilag ekweghị anabata ụmụakwụkwọ ụnyaahụ' - Ụmụakwụkwọ Lee ihe nkiri ga-amasị gị
[ "Nchekwa ndị ụwe ojii", "Ebonyi Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49956829
Ụmụnwaanyị Aba emeela ngagharịiwe maka ajọ ụzọ
Ụmụnwaanyị n'Aba Nkwa akpọkụọla Gọmenti Abịa steeti ka ha gbakwute ha ọsọ enyemaka.
2019-10-08T18:05:17Z
Aba women: Ụmụnwaanyị Aba emeela ngagharịiwe maka ajọ ụzọ
Umunwaanyị Aba emeela ngagharịiwe Ụmụnwaanyị Aba na-eme ngagharịiwe Nke na-eme ugbua bụ na ụmụnwaanyị Aba abadola ngagharịwe maka ajọ ụzọ na enweghịọrụ ha sị na-emekpa ha ahụ. Ụmụnwaanyị ndị a na-echetere ụwa na ọ bụ ha bụ ụmụnwaanyị Aba eji Aba women's riot nke 1926 mara na-akpọkụ Gọvanọ Okezie ikpeazụ ka ọ bịa tinye anya na mmepe Aba. Ụmụnwaanyị a na-ebe akwa enweghị ọrụ, akwụghị ndị ọrụ ụkwọ ọnwa, enweghị ọkụ na-ajọ ụzọ. Ụmụnwaanyị ahụ nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ahịa sị na ha anaghị ahụ ụzọ ha sị aga imeobodo egote ahịa. Mana Gọmmentị Abịa steeti na-ebo ebubo na ndị na-eme ngaghari iwe bụ ndị egotere egote. N'aka ọzọ, otu ụmụnwaanyị ọzọ pụtara na-akwado Gọvanọ Ikpeazu. Onyeisiala Buharị agụpụta usoro mkpata na mmefu nke 2020 Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọpụtala ego ndị Tarị iri na ụma asaa bụ ego ọ na-ele anya imefu maka ọrụobodo ha ga-abado n'afọ 2020. Buhari sị na-atụrụ anya na ego a ga-abata sịte n'ire mmanụ agbidi ruru otu nde na ụma iri asatọ na isii kwa ụbọchị na ọnụego dọla iri ise na asaa. Ọ kwụkwara na ọ bụ na ụtụisi VAT ka ya bụ usoro tubedere isi bụ nke ha ga-eji bado ọrụ na mmepe agụmakwụkwọ, ahụike nakwa ihe ndị ọzọ eji enyere ndụ aka. Onyeisiala sị na ha jiri gụpụta akwụkwọ mkpata na mefu akụ ngwangwa bụ ka enwere ike tinyere ya n'ọrụ malite na ọnwa mba afọ 2020. Onye ọkammụta ndị Ghana agaala izuike Prof. Ransford Gyampo N'ofesi e Mahadum ndị Ghana agwala ndị ọka mmụta abụọ ahụ ihe nkiri BBC gbara n'anwụ ha nọdụgọdi n'ụsọ ka ewere nyọchacha ya bụ ajọ akwa ha kpara. Ụlọakwụkwọ ahụ dere nke a na akwọkwọ ozi ha degara ndi nta akụkọ bụ ebe ha sị na Ransford Gyampo na ọkankuzi Paul Kwame Butakor ga-abịa ịza ajụjụ maka ebubo a. Nwaanyị mụru nwa agbalahula Usain Bolt n'ọsọ Allyson Felix N'egwuregwu e, nwaanyị mụrụ nwa ọnwa iri akuriela efere nrite Usain Bolt na ọsọ 4x400 mixed relay na World Atletic Championship na-akpọtụ na Doha ugbua. Allyson Felix sị na ike a ya na-akpa bụ ihe ịtunanya dịrị ya n'onwe ya. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Aisha Buharị chọrọ ka ataa ndị meruru ụmụakwụkwọ ahụhụ Dịka akụkọ onye nkuzi mahadum ndị BBC gbara n'anwụ maka ịmetọ ụmụakwụkwọ na Mahadum Legos ka na-ewu, nwunye onyeisiala Aisha Buharị akatọọla agwa a dịka nke rere ure ma kwuo na ya ga-eme ihe niile onwere ike i ji hụ na ndị dị otua nwetere ntaramahụhụ ruru ha. 'Otụtụ ndị nkuzi Unilag ekweghị anabata ụmụakwụkwọ ụnayahụ' - Ụmụakwụkwọ Aka akparala onye nkuzi na-eme ka nwata akwụkwọ rachaa ya utu tupu o bufee ya Okwuru na ụmụnwoke so kwa na ndị a na-emetọ ma kwụọ na ọ ga-anwa i ji hu na ndị niile emetọrọ ọtụa ga-enwe ohere ikwuputa okwu ma ndị metọrọ ha ga erite ntaramahụhụ ruru ha. Ụgbọ kpuru ekpu Ụgbọ mmiri kpuru ekpu Akwa arịri na-ada dịka ụgbọ mmiri kpuru na Kirfi nke Bauchi steeti tara isi mmadụ iri atọ na asatọ . Ọ bụ onyeisi ngalaba na-elekota obodo Kirfi bụ Alhaji Bappa, Abdu Bara Danmalikin gwara ndị ntaakụkọ nke a ma kwuo na mmadụ iri anọ banyere ụgbọ a mana nanị mmadụ abụọ ji isi ha pụta. Mkpagbu ndị Uighur na China Amerịka na ebo china ebubo mmegide ndị Uighur Mba Amerịka amachiela ụlo ọrụ na ngalaba gọọmentị rụrụ iri abụo na asatọ na mba China maka mkpagbụ ndị otu alakụba bụ Uighur(Wiga) na mba ahụ. Ihe mmachia pụtara bụ na tupu ngalaba ndị a azụọ ahia ọbụla n' Amerịka, gọọmentị etiti Amerịka ga-enyocha ma nye ha ikike izu ahia. Syria Ndị mba Amerịka ahapụla mpaghara ụgwụ mba Sirịa. Donald Trump enyela iwu ka ndị agha Amerịka sịte na ogige syria na Mba Trurkey pụọ. Otutu ndị omeiwu nke Amerịka katọro iwu a dịka ndị agha Turkey na agwado ibusa ndị otu Kurd bị na mpaghara ahu agha. Ma cheta na ndị Kurd nyere Amerịka aka ilusa ndị otu oyi egwu ISIL ọgụ ma meria ha na mpaghara ahụ. N'Egwuregwu I so gbaa asọmpị egwuregwu Olimpik nke 2020 a laala na mgbuka. Akụko ga-amasị gị Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti Gọọmentị Abịa state ehibela kọmitii ga-etinye anya n'ọkụ gbara n'Aba Chimamanda Adichie bụ onye nke anọ olu ya ka ada ụda n'Afrịka Otu ọhụrụ a kpọrọ CONUA esila na ASUU kewapụ onwe ha Lee ihe nkiri ga-amasị gị
[ "Syria", "Naijiria", "Ịwakpo mmadu na-ike", "Ọmụmụ na mmụta", "Amerika", "Turkey", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49984171
Malitenu ọrụ n'ọdọugbelu Enugu nke taa nke echi - Ndịomeiwu
E mechiri ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu kamgbe ọnwa Ọgọst iji rụzie ya.
2019-10-09T13:09:14Z
Malitenu ọrụ n'ọdọugbelu Enugu nke taa nke echi - Ndịomeiwu
Ihu ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam Gọọmentị etiti mechiri ọdọụgbọelu a n'ụbọchị 24 nke ọnwa Ọgọst, 2019, maka ịrụ ọrụ n'okporoụzọ ebe ụgbọelu na-agba dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ bụ Henrietta Yakubu si kwuo. Ụfọdụ ndị ụlọomeiwu nta si ọwụwa anyanwụ akpọkuola Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o tinye ọnụ n'okwu gbasara ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu. Obi adịghị ha mma etu e si kpọchie ọdọụgbọelu ahụ kamgbe izuuka isii gara aga, na-enweghị ọrụ ọbụla a na-arụ na ya. Ndịọrụ ụgbọelu n'Enugu Airport na-ebe kpaa maka mmechi e mechiri ya Ọ bụ eziokwu na ọrụ amalitela n'ọdọụgbọelu dị n'Enugwu? Lee ọnọdụ ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu steeti N'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị Wenezdee, ndị omeiwu a kpọrọ oku ka e mee ngwa ngwa dozie ọdọụgbọelu ahụ. Ndị binyere aka n'akwụkwọ ahụ gụnyere Toby Okechukwu, Nkeiruka Onyejocha, Pat Oziokoja, Ofor Chukwuegbo na Amadi Dennis. Ndị ọzọ gunyere Oke Martins, Nnaji Cornelius, Simeon Atigwe, Blessing Onuh, Uko Nkole, Darlington Nwokocha, Valentine Ayika, Francis Agbo na Benjamin Mzondu. Nkeiruka Onyejeọcha Ndị omeiwu ahụ gosiri mwute na kamgbe e mechiri ọdọụgbọelu ahụ, onwebeghị ndị e nyere ọrụ idozi ya. Ha kwukwara na ọdọụgbọelu ahụ bu nke dịkarịsịrị mkpa na mpaghara ọwụwa anyanwụ nile. 'Rụchaanụ ọrụ Akwa Naịja ngwa ngwa' - Ndị omeiwu Ha kpọkukwara ngalaba na-ahụ maka ịrụ ụzọ ka ha mee ngwangwa imezi ụzọ ndị dị n'ala Igbo iji belata ahụhụ ndị mmadụ na-ata n'ụzọ. Cheta na gọọmentị etiti mechiri ụdọụgbọelu Akanu Ibiam kemgbe ọnwa Ọgọst maka nrụgharị ya maka onwebeghị onye ọrụ ahụru ebe ahụ maka ya bụ atụmatụ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Anyị ga-emecha ihe niile gbasara 'budget' 2020 tupu Nọvemba agwụ - Ndị omeiwu Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Enugu Steeti", "Njem ụgbọelu", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49984172
Nne gi na nna gị akuziiri gi maka mmekọrịta nwoke na nwaanyị?
Ihe ndị ntorobịa kwuru gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị.
2019-10-09T13:26:50Z
Nne gi na nna gị akuziiri gi maka mmekọrịta nwoke na nwaanyị?
Ndị ntoroọbịa kwuru etu ha si mata ihe gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị. N'oge ugbua, ndị ọkachamara na-ekwu na ọ dị mkpa ibido n'oge kuzibere ndị ntoroọbịa maka mmekọrịta nwoke na nwaanyị. Nke a bụ iji mee ka ha mata ọghọm dị na okoro erughị eru wara ọgọdọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
[ "Mmekọ nwoke na nwanyị", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49956836
Onye sị na anyị anaghị akwụ ndị ọrụ ụgwọ n'Abia steeti tụrụ ashị
John Okiyi bụ Komishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Abia steeti kwuru na ụmụnwaanyi Aba mere ngagharịiwe bụ ndi egoro ego.
2019-10-09T17:06:51Z
Okwu John Okiyi maka ngagharịiwe ụmụnwaanyị Aba mere
[ "Abia Steeti", "Ngosi iwe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49984169
Ndị ji asambodo adịgboroja akala nkụ - NYSC
Ngalaba na-ahụ maka ndị ji otu afọ efe ala nna ha bụ NYSC sị na anwụchiela ọtụtụ ndị ji asambodo adịgboroja na-achọ ife ala nna ha.
2019-10-09T17:23:07Z
NYSC Camp: Ndị ji asambodo adịgboroja akarịala - NYSC
Akụkọ dị mkpa: Anyị nwụchiri ndị ji asambodo adigboroja - NYSC Ngalaba na-ahụ maka ndị ji otu afọ efe ala nna ha bụ NYSC sị ha nwụchiela ụmụakwụkwọ dị iri itoolu na ise ji asabodo adịgboroja bịara ife ala nna ha. Onyeisi NYSC bụ Brigadier General Shaibu Ibrahim kwuru nke na wednezde n'oge ọmụmụ ihe ịnabata ndị agba ọ hụrụ. 'Anyị anaghị eziga ndị kọpa n'ụlọ ọfụfe' - NYSC Kemi Adeosun: Ihe NYSC kwuru maka asambodo Ọ sị na mmadụ iri isii na ise n'ime ha sị na mahadum ndị nọ na Naịjirịa ebe iri atọ si na madahum na-anọghị na Naịjirịa. Ọ kwara arịrị maka etu ịkpụ asamboso adịgboroja si arị ibe ya elu na Naịjirịa na ọ bụ n'ihi nke a mere ha ji hiwe ọmụmụ ihe a. Atụmatụ ga-emegide idina ụmụakwụkwọ na Madadum Ndị ụlọomeiwu etinyela atụmatụ iwu ga-egbochi ndị nkuzi idina ụmụakwụkwọ ha na mahadum . N'ozi osote onyeisi ndị Sịnetị bụ Ovie Omo-Agege kwuru na nyocha ọhụrụ a BBC wepụtara ga-enye aka ịkwalite ime ga atụmatụ a bụrụ iwu na Naịjirịa. a gụpụtara iwu n'ụlọomeiwu na Wednezde, ọ bụrụ na e mee ya dịka iwu, ọ ga-ara onye nkuzi ahụ ịchọ idina nwata akwụkwọ. Bọjetị a bụ nke ụtụ isi - Abaribe Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchite anya Abia South n'ụlọomeiwu akatọọla akwụkwọ mkpata na mmefu nke 2020 ma kwuo na ọ bụ bọjetị ụtụ isi. Cheta na onyeisiala Buhari gụpụtara akwụkwọ mkpata na mmefu a ọ kpọrọ bọjetị maka mwulite akụnaụba na ọrụ n'ihu ndị ụlọomeiwu ụnyaahụ. Ndị omeiwu Naịjirịa ekwela nkwa na ha ga-agba mbọ ihụ na ha mechara nnyocha atụmatụ nweta na mmefu ego maka afọ 2020 tupu ọnwa Nọvemba agwụ. Benjamin Kalu bụ ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu nta gwara ndị ntaakụkọ nke a na ụnyaahụ. O kwuru na ha ga-agbalị ịhụ na Bọjetị nke afọ 2020 malitere n'ọnwa Janụwarị kpọmkwem. N'okwu ya, ụlọomeiwu ahụ ewepụtala abalị iri atọ nke ọnwa Ọktoba ruo abali ise nke ọnwa Nọvemba maka ngalaba gọọmentị dị icheiche ịbịa kọwaa etu ha ga-esi mefuo ego n'afọ 2020. "Anyị agaghị anabata ngalaba ọbụla na-abịaghị kọwaa bọjetị ha ma Nọvemba 5 gachaa." "Nọvemba 6 ka anyị ga-amalite ikpokọta nakwa ịhazi bọjetị ngalaba dị icheiche ruo Nọvemba 27." Buharị ga-ebupute akwụkwọ etu gọọmenti ga-esi mefu ego n'afọ na-abịanụ "Anyị na-atụ anya na anyị ga-emecha ihe niile gbasara Bọjetị 2020 na Nọvemba 28." Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari wepụtara Bojetị 2020 n'ụbọchị Tuzde, abalị itolu nke ọnwa Nọvemba. Bọjetị ahụ gosiri na Naịjirịa ga-emefu ego dị tarị naịra iri na ụma atọ na atọ n'afọ na-abịa abịa. Na Turkey Ụgbọelu agha ndị Turkey agbala ogbunigwe na mpaghara ugwu mba Syria n'ihe iwe bụ nke nwereike ibute agha n'etiti ha na ndị agha nnupuisi Kurdish. Onyeisiala mba Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan sị na nke a bụ iji chụsaa ndị agha Kurdish ma mee ka nchekwa dị n'ogige ahụ. N'egwuregwu William Troost-Ekong na-agbara ndị Udinese nke mba Italy. Nne ya bụ onye mba Netherlands ebe nna ya bu onye Akwa Ibom steeti. Nkeji Ihe nkiri N'Amerịka Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump Ụlọọrụ onyeisiala Donald Trump ekwuola na ha agaghị akwado nnyocha nke ndị omeiwu mba ahụ na-enyocha onyeisiala iji chutuo ya n'ọkwa. Ha kwuru na nnyocha ahụ enweghi isi na ọdụ bịa bụrụkwa ihe na-adabaghị n'iwu mba Amerịka. N'egwuregwu Tammy Abraham Ndị otu egwu bọọlụ mba Ịngland ekwekọrịtala na ha agaghị anabatazi ịkọ ọnụ agbụrụ n'asọmpị ha na-agba iji tozuo isonye n'egwuregwu Euro 2020 Tammy Abraham gwara ndị ntaakụkọ na ha kwekọrịtara na ha ga-akwụsị ịgba bọọlụ ma si n'ama egwuregwu pụọ. Mba Ịngaland ga-ezute ndị Chek Rịpọblik n'ụbọchị Fraịde, abalị iri na otu nke ọnwa Nọvemba ma zutekwa Bulgeria ụbọchị Mọnde, abalị iri na anọ. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti A kpochiela ụzọ Dkt Boniface Igbeneghu na Unilag Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Syria", "Naijiria", "Egwuruegwu", "Abia Steeti", "Okezie Ikpeazu", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Turkey", "Akụ na ụba", "Ndịagha", "Muhammadu Buhari", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49994229
Ihe ndị mmadụ kwuru maka 'Sex for Grades'
Ọtụtụ ndị gụnyere ndị ntoroọbịa na ndị okenye akọwaala ebumnobi ha banyere akụkọ ndị nkuzi idina ụmụakwụkwọ ha iji nye ha akara.
2019-10-09T19:21:26Z
Sex for Grades: Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya
Ọtụtụ ndị gụnyere ndị ntoroọbịa na ndị okenye akọwala ebumnobi ha banyere akụkọ ndị nkuzi idina ụmụakwụkwọ ha iji nye ha akara. N'ajụjọọnụ BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị mmadụ, ha gbarụrụ ihu kwuo na ụdị agwa jọgburu onwe ya. Otu nwata akwụkwọ sị n'agbanyeghi na nna ya bụ onye nkuzi na ndị nkuzi ibe ya na-akpị ya anya ka ọfọdụzie ndị nne ha ma ọ bụ nna ha na-abụghị ndị nkuzi. Onye nke ọzọ sị n'agbanyeghi na ụmụakwụkwọ na-achụ ndị nkuzi mgbe ụfọdụ, kama na ọ dị onye nkuzi ahụ n'aka ịgbọja ụmụakwụkwọ dị etu a. Ihe niile ha kwuru nọ n'ime ihe onyonyo a: Akụkọ ndị ga-amasị gị:
[ "Okike", "Mmegbu", "Naijiria", "Ịwakpo mmadu na-ike", "Ọmụmụ na mmụta", "Ikike ụmụnwanyị", "Mmekọ nwoke na nwanyị", "Mmeru nwata" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49994248
Ndịagha Naijirịa anwụchiela otu onye Boko Haram a na-achọ kemgbe 2016
Ndịagha Naijirịa anwuchiela otu onyeisi ndị Boko Haram ha na-achọ kemgbe afọ 2016.
2019-10-10T05:30:26Z
Boko Haram: Ndị agha Naijirịa anwụchiela otu onye Boko Haram a na-achọ kemgbe 2016
Ndị Boko Haram ndiagha si na ha nwuchiri. Ndị Agha Naijirịa anwuchiela Alhaji Bukar Modu e ji Modu China bụ onyeisi ọkwọ ụgbọala ndị Boko Haram. Bukar Modu bụ onye nke iri asatọ na itolu n'ime ndị oyi egwu nke ndị agha Naijirịa deputara a na-acho achọ. Boko Haram awakpoola Maiduguri ọzọ Etu Boko Haram si gbuo onye ọrụ enyemaka Ọ bụ n'ụbọchị Wenezde ka e jidere Modu na ndị Boko Haram itolu ọzọ. Ndị Boko Haram ndị agha na-achọ Ndị agha Naijirịa depụtara nke a n'igwe twitter ha. Akụkọ ga-amasị gị Malitenu ọrụ n'ọdọugbelu Enugu nke taa nke echi - Ndịomeiwu Ụmụnwaanyị Aba emeela ngagharịiwe maka ajọ ụzọ 'Onye nọchiri ụzọ Gọvanọ n'okporo ụzọ ga-anata ntaramahụhụ' - Umahi Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti Ihe Nkiri ga-amasị gị
[ "Boko Haram", "Islamic State group", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49996787
Adị m ndụ, anwụbeghị m - 'Sky B'
Akụkọ wuru na soshal midia na Sky B nwụrụ ka o nwechara ọrịa obi.
2019-10-10T11:52:25Z
Sky B Death Rumour: Adị m ndụ, anwụbeghị m
Sky B Sky B Onye otiegwu e ji 'Sky B' mara ekwuola na akụkọ gbasara ọnwụ ya bụ asị. Akụkọ malitere iwu na soshal midia abalị abụọ gara aga na-ekwu na Sky B nwụrụ mgbe ọrịa obi gbuturu ya. Ọtụtụ ụlọ ntaakụkọ a ma ama buru ya bụ akụkọ. Egwu anọ e ji mara ndị Igbo #ThisisNigeria: 'Agaghị m ewepụ egwu m' Mana onye nlekọta Sky B bụ Saint Opara gwara BBC Igbo n'ekwentị n'ụbọchị Tọọzdee na akụkọ ahụ abụchaghị eziokwu. O kwuru na Sky B nwere ọrịa obi nke buturu ya n'ụbọchị Tuzde nke mere ka e buru ya gbaga ụlọọgwụ. Opara kwuru na mgbe e bugara ya ụlọọgwụ, "dọkịta kwuru na Sky B nwere ike ịnwụ mana o mechara gbakee." "Ọ sila n'ụlọọgwụ laa kamgbe ụnyaahụ (Wenezde)." Sky B dekwara ihe n'akara 'instagram' ya na-akọwa ihe mere ya. Ọ rịọrọ ndị mmadụ ka ha kwụsị ike akụkọ maka ọnwụ ya kama ka ha kee akụkọ maka egwu ya. Ihe Sky B dere n'akara 'instagram' ya. Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na Sky B kpacha anya malite akụkọ maka ọnwụ ya. Ha kwuru na o mere nke ahụ iji kwalite egwu ọhụrụ o tiri. Ndị ọzọ kwuru na o mere ya ka aha ya wee wuo ewu. Kedukwanu onye malitere asịrị a na Sky B anwụọla? Akụkọ ga-amasị gị: 'Innoson Motors' e bunyere Mercy BBNaija ebutela ụka na soshal midia Ndịagha Naijirịa anwụchiela otu onye Boko Haram a na-achọ kemgbe 2016 Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Ịkpa obi aṅụrị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49996788
Ọ ga aka mma ma akụchapụ ụlọomeiwu Senate?
Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu akwuola na ọ ga-aka mma ma ahapụ naanị otu ụlọomeiwu ije gbochie oke mmefu ego.
2019-10-10T12:57:54Z
Unicameral Legislature: Ọ ga aka mma ma akụchapụ ụlọomeiwu Senate?
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49996786
Ọ ga aka mma ma akụchapụ ụlọomeiwu Senate?
Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu akwuola na ọ ga-aka mma ma ahapụ naanị otu ụlọomeiwu ije gbochie oke mmefu ego.
2019-10-10T13:19:55Z
Unicameral Legislature: Ọ ga aka mma ma akụchapụ ụlọomeiwu Senate?
Ụlọomeiwu ukwu na nke nta Ụlọomeiwu ukwu na nke nta. Naịjirịa nwere ụlọomeiwu abụọ. Nke ukwu bụ 'Senate' ebe nke nta bụ 'House of Representatives'. Gọvanọ Igbo ise 'lara ezumiike nka' n'ụlọomeiwu 2019 Senate President: Onye Igbo o nwere ike ịbụ onyeisi Sịnetị? Enwere ndị mmadụ otu narị na itoolu n'ụlọomeiwu ukwu. Ụlọomeiwu nta nwere ndị otu narị atọ na iri isii. Kayode Fayemi, Gọvanọ Ekiti Steeti Mana ọtụtụ ndị na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị na-eme iwu na Naịjiria buru nnkwu ibu. Ha na-ekwu na ọ ga-adị mma ma a kụchapụ otu n'ime ụlọomeiwu ahụ. N'ụbọchị Wenezde, Gọvanọ Ekiti Steeti kwuru na ọ ga-aka mma ma e wepu ụlọomeiwu sineti kpam kpam. N'okwu ya, "Ụlọomeiwu dị mkpa bụ 'House of Reps'". Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu ahụ bụ Rochas Okorocha. Ọ gwara BBC na mkparịtaụka na ọ ga aka mma ma ọ bụrụ naanị otu sinetọ na-anọchi anya steeti ọbụla kama atọ. Chidi Lemchi, onye ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara ọchịchị gwara BBC Igbo na ya kwadoro ka e wepu ụlọomeiwu sineti. Lemchi kwuru na ndị ụlọomeiwu nta bụ ndị kacha mkpa n'ihi na ha na-anọchite anya ndị kacha nta n'okpuru ọchịchị niile. Mana o kwukwara na ego a na-akwụ ndị omeiwu kwesịrị ịgbadata. Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: 'Innoson Motors' e bunyere Mercy BBNaija ebutela ụka na soshal midia Ndịagha Naijirịa anwụchiela otu onye Boko Haram a na-achọ kemgbe 2016 Adị m ndụ, anwụbeghị m - 'Sky B' Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49956833
A wakpoola ụlọahịa m n'Aba - Jane Ogbuata
'Gọmenti Abia enweghi efe ịchụgharị onye ọbụla' - John Okiyi
2019-10-10T13:44:33Z
'A wakpoola ụlọahịa m n'Aba'
Onyeisi otu ụmụnwanyị 'Women for change initiative and Equity Organisation' Jane Ogbuata bụ onyeisi otu ụmụnwanyị a kpọrọ 'Women for Change Initiative', bụ ndị mere ngagharịiwe n'ụbọchị Mọnde, agwala BBC Igbo na awakporo ụlọakụ ya n'Aba n'ehihie Tọzde. O buruụzọ gwa BBC Igbo na ndị otu ndọrọndọrọ PDP nakwa ndị gọọmentị Abia steeti na-eyizi ya egwu nke ukwu. Ọ gwara BBC Igbo na nke a malitere kamgbe ha mechara ngagharịiwe ahụ. O kwuru sị "Kamgbe abalị abụo gara aga, ehibeghị m n'ụlo m." "E nwere ndị ji ụgboala ojii bia nọrọ n'ihu ọdụahia m n'Ikotekpene road, Ogbor hill, Aba." Gọọmenti Abia state emeela nzacha na mkpopu n'Abia Poly Ụmụnwaanyị Aba emeela ngagharịiwe maka ajọ ụzọ Nke a na-abịa dịka Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi Abia steeti bụ John Okiyi kwuru na a kwụru ụmunwaanyị ndi ahụ mere ngagharịiwe ụgwọ. Mana Jane Ogbuata kwuru na ọnweghi onye kwụru ha ụgwọ ma ncha. O kwukwara na onweghị otu ọbụla ha na ha na-arụkọ "Ihe kacha kpalie mmụọ m bụ mgbe onye otu anyi bi na Ngwa Road ime na-eme, mana maka ụzo ọjọọ, nwaanyị ahụ nwụru tupu a kpọga ya ụlọ ọgwụ." Ndị otu 'Women for change initiative and Equity Organisation' Ogbuata kwuru na "Gọọmentị rụo ụzo, ụmunwaanyi ahu ụzo gaa ahia, ụmụ anyị a gaa akwụkwọ, ndị mmadụ enwee ike bata Aba zụo ahia." O kọwara na ọ bụ ikike ha n'ọchichi onyekwuoucheya ime ngagharị iwe. Jane Ogbuata kwuru na ha anaghi ezo onwe ha ezo. Okezie Ikpeazu o ji ndị ọrụ gọọmentị Abia state ụgwọ akwụ akwụ? O nweghi ngagharịiwe ndị ọrụ chọrọ ime n'Abia State - Obigwe O kwuru na aha otu ha bụ 'Women for change initiative and Equity Organisation' na ha na-enwe nzụkọ ha na 'CS park'. Ọgbuata kowara na ha nwere uwe ha na-eyi dịka otu, kama mmadụ niile bụ ndị otu ha na-aga ahia azuta nke ya. Gịnị ka PDP kwuru? Mgbe BBC kpọtụụrụ onyeisi ndị PDP n'Ukwa East bụ Okechi Nwohu onye kwuru na ebubo na ndị PDP na eyi Jane Ogbuata bụ asi. O kwuru na ọchịchị Gọvanọ Okezie Ikpeazu agaghi eme ihe dị etu ahụ. Abia steeti abụghị ọchịchị tigbuo zọgbuo nweghi Kọmishọna mgbasa ozi bụ John Okiyi ekwuokwala na 'Gọmenti Abia enweghi efe ịchụgharị onye ọbụla'. Ọ zị na Gọvanọ Okezie Ikpeazu enweghi efe tigbuo zọgbuo."Ndị ahụ bụ ndị azụrụ azụ" -John Okiyi, Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Abia steeti kwuru Mana kọmishọna mgbasa ozi bụ John Okiyi gwara BBC Igbo na ụmụnwanyị ruru otu narị ndị mere ngagharịiwe bụ ụmunwaanyị ndị otu ọzọ kwụrụ ụgwọ ka ha mee ngagharịiwe megide Gọvanọ Ikpeazu. Mazi John Okiyi kwuru na ọ bụ otu nwaanyị ọ kpọro 'Madam Jane' bidoro n'ịzụụka atọ gaara aga acho ụmunwanyi ọ ga akwụ ụgwọ ka ha soro ya mee ngagharịiwe. O kwukwara na ọ ma ndị ha na madam Jane soro kpaa nkata a. Okeiyi kwuru maka ihe onyonyo gosiri ebe ụmụnwanyị a na-anara ego n'ihu ụlọ 'Madam Jane'. Ndị nkuzi Abia Steeti ha ka nọ n'abụbụọrụ? Okezie Ikpeazu o ji ndị ọrụ gọọmentị Abia state ụgwọ akwụ akwụ? Kama mgbe BBC lere ya bụ ihe onyonyo, e gosighi ebe ụmụnwaanyị a na-anara ego. Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe ha na-edebanye aha ha n'akwụkwọ. Mazị okiyi kwukwara na ụmụnwanyi ọzo ndị ruru narị atọ hụru nkata ọjọọ ndịa mere ngagharịiwe kpara wee pụta mee ngagharịiwe nke imegide ihe Mazi okiyi kpọrọ nkata imegide gọomentị gọvanọ Abia seeti. Maka iji ụgwọ Mazi John Okeiyi kwuru na onweghi onye na-arụrụ gọọmentị Abia steeti ọrụ e ji ụgwọ. O kwukwara na ọ bụghị gọọmentị Abia steeti ka ọ dịrị ịkwụ ndị Abia steeti Politeknịk (AbiaPoly) na ndị ụlọọgwu mmụta nke Mahadụm Abia steeti ụgwọ (ABSTH). Gee akụkọ ga-amasị gị Ekpochiela ụzọ onye nkuzi Unilag Malitenu ọrụ n'ọdọugbelu Enugu nke taa nke echi - Ndịomeiwu 'Onye nọchiri ụzọ Gọvanọ n'okporo ụzọ ga-anata ntaramahụhụ' - Umahi Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti
[ "Naijiria", "Abia Steeti", "Ngosi iwe", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ikike ụmụnwanyị", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50002725
Gọọmentị Abia steeti jị ndị ABSU ụgwọ enyemaka
Ndị ụlọomeiwu nke Abia steeti ga-enwe nzụkọ ka ha mara etu ha ga-esi mee ka akwụọ ụgwọ enyem aka eji ndị mahadum Abia steeti.
2019-10-10T14:05:35Z
'Gọọmentị Abia steeti jị ndị ABSU ụgwọ enyem aka' - Ụlọomeiwu Abia steeti
Abia State University Ngalaba ụlọomeiwu Abia steeti na-ahụ maka agumakwụkwọ edepụtala nchọpụta ha maka ego gọọmenti Abia steeti ji mahadum nke steeti e ji ABSU mara. Onye n'ahu maka mgbasa ozi na ntaakụkọ nke ndị ụlọomeiwu Abia steeti bụ Jude Ndukwe kwuru na ihe ha nyochapụtara gosiri na gọọmentị Abia steeti ji mahadum ahụ ụgwọ enyemaka ha kwesiri inye ha kwa ọnwa. Lee ọtụtụ ihe akụ ọnatarachi juputara n'Abia State nke nwere ike ime ha ọgaranya Gọọmenti Abia state emeela nzacha na mkpopu n'Abia Poly Ụgwọ a bụ ego ndị gọọmenti steeti na enye ụfọdụ ngalaba nke gunyere mahadum iji kwado ha. Ndukwe kwuru na gọọmentị jị mahadụm ahụ ụgwọ a ọnwa ole na ole. Ka o di ugbu a, ndi ụlo omeiwu ga-enwe nzuko ebe ha ga atule ụgwo a eji ụlọ akwụkwọ ahụ. 'Anyị akwapịaghị ụlọ oriri ndị ahụ maka akwụnakwụna' O nweghi ngagharịiwe ndị ọrụ chọrọ ime n'Abia State - Obigwe O kwuru na ihe nwere ike ime ma ha mechaa nnyocha ha gunyere: 1) Ha ga-akpọ Kọmishọna na-ahu maka agumakwụkwọ ka ọ kọwaa ihe mere ha ji jiri mahadum a ụgwọ. 2) Ha nwekwara ike inye ikike ka gọmenti steeti kwụo ụgwo a niile. 4) Ha nwekwara ike itụnye aro ka ewetuo ụgwọ enyemaka a, ka gọọmentị steeti nwee ike ịkwụ ya. Ahọpụtabeghị ndị ga-arụ ọrụ dịka ndị komishọna n'Abia steeti. Gụo akụkọ ga-amasị gị 'Innoson Motors' e bunyere Mercy BBNaija ebutela ụka na soshal midia A kwụrụ ụmụnwaanyị mere ngagharịiwe n'Aba ụgwọ - John Okiyi Adị m ndụ, anwụbeghị m - 'Sky B' Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Abia Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50002728
'Obi ịdamba mere ka m chere na igbu onwe m kara m mma'
Otu nwaaghọghọ gbanarịrị obi ịdamba akọwaala ihe ndị ọ gabigara mgbe ọ hụtara onwe ya n'ime ọnọdụ a.
2019-10-10T15:05:54Z
World Mental Health Day: 'Obi ịdamba mere ka m chere na igbu onwe m kara m mma'
Nwaada rịaburu ọrịa obi ịdamba kọwara ihe butere ọrịa a nakwa ihe ndị ọ hụrụ n'ime ọnọdụ a obi ịdamba. O kwuru na ọ nweghi ike ịkọwa ihe kpatara obi ji na-ada ya mba ma ọ bụrụ na a jụọ ya. Nwaada gara n'ihu kwuo na nke a mere o ji chee na igbu onwe ya kaara ya mma. Ọ dọkwara ndị mmadụ nwere obi ịdamba aka na ntị ka ha gaa n'ụlọọgwụ iji nyere onwe ha aka. Akụkọ ndị ga-amasị gị:
[ "Ahụike echiche", "Ahụike", "World Health Organization (WHO)", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49996784
Mahadum Rivers enyela ụmụakwụkwọ akara ekwentị maka mkpesa ndị na-edina ha
Mahadum Rivas Steeti ewepụtala akara ekwentị ebe ụmụakwụkwọ ga-eme mkpesa maka ndị nkuzi na-achọ idina ha.
2019-10-10T19:08:11Z
Sex for Grades: Mahadum Rivers enyela ụmụakwụkwọ akara ekwentị maka mkpesa ndị na-edina ha
Akụkọ dị mkpa: Mahadum Rivas Steeti akara ekwentị maka mkpesa Ọkammụta Opuenebo Binya Owei Mahadum Rivas Steeti dị mbụ nwee ukporo iwu ụmụakwụkwọ ga-eji mee mkpesa banyere nke a mana ụjọ anaghị ekwe ha mee ya. Mahadum Rivas Steeti ewepụtala akara ekwentị ebe ụmụakwụkwọ ga-eme mkpesa maka ndị nkuzi na-achọ idina ha. Nke a na-abịa n'ime ụbọchị atọ BBC wepụtara akụkọ maka nyocha ndị nkuzi mahadum na-edina ụmụakwụkwọ na mpaghara Afrịka (Mahadum Legọs na Gana). Onye nkuzi Unilag na-enye ụmụakwụkwọ nsogbu iji dinaa ha amala n'ọnya A kpochiela ụzọ Dkt Boniface Igbeneghu na Unilag Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi mahadum a bụ Ọkammụta Opuenebo Binya Owei gwara BBC na ọ bụ ka ụmụakwụkwọ nwee ike ịkpọpụta ndị nkuzi na-akpa ụdị arụ a. Ọ sị na ihe mere o ji bụrụ ihe nzuzo bụ ka ụmụakwụkwọ ghara ịtụ ụjọ ihe ga-eme ha ma ha kpọọ onye nkuzi aha. Mahadum a so na dị a kpọrọ aha na soshal midia ka e nyocha ndị nkuzi ha maka idina ụmụakwụkwọ. Buhari na Jonathan Zutere n'Aso Rock taa: Ihụkwara Foto Onyeisiala Muhammadu Buhari na Goodluck Jonathan ebe ha na-ekwe n'aka na-achị ọchị n'Asọ Rock. Nke a mere mgbe Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa nyefere Buharị ọchịchị n'aka gara n'isi ọchịchị Naịjirịa dị n'Abuja. O nweghi onye mara ihe bụ isi mkparịtaụka ime ụlọ ha mere were nkeji iri dịka Jonathan. Nke a butere ọtụtụ okwu na soshal midia nke otu onye na Facebook sị na 'ọ dịka Jonathan ọ chọwala ịbanye APC'. Na Sudan Nwada Neemat Abdulllah abụrụla onyeisi ọkaikpe nwaanyị mbụ na Sudan Ọ dịla anya ọtụtụ mmadụ na-achọ ka e nyekwuo ụmụnwaanyị ọkwa dị elu na mba ahụ. Nkeji Ihe nkiri 'Innoson Motors' e bunyere Mercy BBNaija ebutela ụka na soshal midia Ụgbọala Innoson Motors BBNaịja bunyere Mercy Dịka Mercy Eke, onye e ji Lamborghini wee mara nwetachara mmeri n'egwuregwu Big Brother Naija, okwu gbasara ihe nrite e nyere ya ka na-ewu na sosha midia. Mercy ritere ego dị nde naịra iri atọ na ihe nrite ndị ọzọ ọnụ ego ha ga-erukwa nde naịra iri atọ. Otu n'ime ihe nrite ndị a bụ ụgbọala Innoson Motors. 'Lamborghini' Mercy abụrụla Ugoeze Big Brother Naija Mpị Tasha na Mercy sụrụ n'ụlọ Big Brother Naija bụzi okwu akpụ n'ọnụ Tacha atachaala ụkwa jaa eze na Big Brother Naija Mana otu onye a ma ama na soshal midia bụ Tunde Ednot kwuru na Innoson Motors e bunyere Mercy ekwesighị ekwesị. Ednut kwuru na ya che na a ga-ebunye Mercy ụgbọala 'G-wagon' maọbụ 'Range'. Mana Ednut mechara wepu ihe ahụ o dere n'akara 'intsgram' ya. Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ihe ahụ Ednut kwuru. Ha sịrị na ọ magburu onwe ya bụ ụgbọala Innoson Motors e bunyere Mercy n'ihi na ọ ga-enye aka ịịkwalite ụgbọala a rụrụ na Naịjirịa. Mana ụfọdụ na-ekwu na ụgbọala ahụ erughị nde naịra iri abụọ na ise bụ ego ole ndị BBNaija kwuru na ha zụrụ ya. Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ kwuru: @DrJoeAbah kwuru na ọ zụrụ ụgbọala Innoson n'ihi na ọ dị mma. @realVirusMedia kwuru na ọdịghị ya ka ụgbọala ahụ e bunyere Mercy eruru ego ole e kwuru na a zụrụ ya. @youngsam_my kwuru na ụgbọala Innoson Motors zuru ka e mee. Ụlọọrụ Innoson Motors tinyekwara ọnụ n'okwu ahụ. He kwuru na ha na-agba mbọ ịkawanye mma dị oge na-aga. N'akụkọ ọzọ Dịka BBC gbachara ndị nkuzi mahadum na-achọ idina ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị n'anwụ, ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa amalitela itule iwu ọhụrụ ga-eme ka onye ọbụla mere ụdị omume ahụ ọzọ gaa nga afọ ise. Onye na-akwado iwu a bụ Ovie Omo-Agege onye bụ osote onyeisi Senate ma bụrụkwa sịnetọ na-anọchite anya Delta Central n'ụlọomeiwu ukwu. N'ofesi Nabil Karoui na-ekele ndị nkwado ya Ụlọikpe na mba Tunisia atọhapụla Nabil Karoui bụ onye so azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka a ga-eme na mba ahụ ụbọchị ụka. Karoui nobu na mkpọrọ n'ihi ebubo nrụrụaka na iji aghụghọ zere ịtụ ụtụisi, mana ọ na-ekwusi ike na aka ya dị ọcha. N'egwuregwu Aha a na-akpọ ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa na-erubeghị afọ iri na-asaa bụ 'Golden Eaglets'. Ndị otu egwu bọọlụ Naịjiria na-erubeghị afọ iri na asaa agawala mba Brazil iji sonye n'asọmpi iko mba ụwa maka ndị na-erubeghị afọ iri na asaa. Asọmpi a ga-ebiri ọkụ bido n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba ruo abalị iri na asaaa nke ọnwa Novemba. Naịjiria nọ n'otu B n'asọmpi nke afọ a Naịjirịa abuola iko mba ụwa ndị na-erubeghị afọ iri na asaa ugboro ise. Ha gunyere nke afọ 1985, 1993, 2007, 2013, na 2015. Naịjirịa, Họngarị, Ekuadọ na Ọstrelia nọ n'ọtu B n'asọmpi nke afọ a. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ndịagha Naijirịa anwụchiela otu onye Boko Haram a na-achọ kemgbe 2016 Malitenu ọrụ n'ọdọugbelu Enugu nke taa nke echi - Ndịomeiwu Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ gbasara budget 2020 Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Ikike ụmụnwanyị", "Ekwentị", "Riva steeti", "Ụmụnyanyị", "Ụmụntoroọbịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50002731
Mụ na Buhari? Nke a bụ asịrị
BBC anụtala n'ọnụ onye enyemaka Sadiya Umar Farouq na akụkọ na ya na onyeisiala ga-agba akwụkwọ bụ asịrị.
2019-10-11T05:11:17Z
Sadiya Umar Farouq: Mụ na Buhari? Nke a bụ asịrị
Sadiya Umar Farouq Dịka ka akụko na efeghari na Sadiya Umar Farouq na onyeisiala ga-agba akwụkwọ taa. BBC jụrụ onye enyemaka ya ma eziokwu o dị n'akụkọ a . Ọ gwara BBC na akụkọ ahụ bụ ezigbote asi. Kedu Onye bụ Sadiya Umar Farouq? Sadiya Umar Farouq bụ Mịnista na-ahụ maka ihe gbasara mmadụ, ọrụ gbata gbata na mmekọrịta madụ na ibe ya. Bekee kpọrọ ngalaba ahụ 'Ministry of Humanitarian Affairs, Disaster Management and Social Development'. Nke a bụ otu n'ime ndị ngalaba onyeisiala Muhammadu Buharị kewapụtara ọhụrụ n'afọ a. Ụmụnwanyị asaa nwetara ọkwa minista Ogah, Ikeazor na Nwajiuba ketara ngwupụta ihe dị n' ala, gburugburu nakwa agụmakwụkwọ A mụrụ Sadiya Umar Farouq na Nọvemba 5, 1974. Ọ bụ onye Zamfara steeti n'okpuru ọchịchị Zurmi dị na mpaghara ugwu nke Naijirịa. Ọ gara akwụkwọ Sekọndịrị na 'Federal Girls college' nke dị na Gusau, Zamfara steeti. Ọ nwere asambodo "Business Administration" na mahadum nke Ahmadu Bello Zaria, Kaduna Steeti. O nwekwara asambodo osote ọkammụta na "International Affairs and Diplomacy" ma tinyekwa nke "Business Administration" (MBA) sitere na Mahadum Ahmadu Bello. Farouq bụbu onyeisi ngalaba na-elekọta ndị gbatara ọsọ ndụ na Naịjirịa nakwa ndị enwghị ebe obibi n'ihi agha maọbụ ihe ndapụta. Ọ ruburu ọrụ dịka onye ojide ego ndị 'All Progressive Congress' site n'Ọnwa Jun 2013 ruo Jun 2014. O sokwa na ngalaba nke APC hụrụ maka nhọpụta Buharị dịka ọnyeisiala Naijirịa. Farouq bụkwa onye ojide ego otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Congress for Progressive Change' ebe Buhari nọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2011. Akụkọ ga-amasị gị Mahadum Rivers enyela ụmụakwụkwọ akara ekwentị maka mkpesa ndị na-edina ha A wakpoola ụlọahịa m n'Aba - Jane Ogbuata Ọ ga aka mma ma akụchapụ ụlọomeiwu Senate? Ndịagha Naijirịa anwụchiela otu onye Boko Haram a na-achọ kemgbe 2016
[ "Naijiria", "Ụmụnyanyị", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50002733
Azọpụtala ụmụakwụkwọ ndị ntọ tọrọ na Kaduna steeti
Ndịagha Naịjirịa azọpụtala ma memila ụfọdụ n'ime ndị omekome tọrọ ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ na Kaduna steeti n'ụtụtụ Tụzde.
2019-10-11T12:49:50Z
Kaduna kidnapping: Ndịagha azọpụtala ụmụakwụkwọ 6 atọrọ n'ụbọchị tụzde na Kaduna steeti
Egbe a natara ndị omekome na Kadụna Steeti. Ndị agha Naịjirịa anya na-acha ọkụ bụ ndị 'Operation Thunder Strike' azọpụtala ụmụakwụkwo atọrọ ma memila ndị ntọrọ tọrọ ha. Ụmụakwụkwọ a bụ ndị na-agụ na 'Government Day secondary school' Gwagwada nke dị n'okpuruọchịchị Chikun na-aga akwụkwo n'ụbọchị Tụzde mgbe ndị ntọrọ a tọrọ ha. Boko Haram sị ka akwụọ N100m n'isi Abraham Amuta Ndị ntọrị anwụrụla ụmụakwụkwọ isii na Kaduna Ndịagha a na-eme ngagharị nchekwa okporoụzọ mgbe ha nwetere ozi na ndi omekome na-awakpo ndi mmadụ n'okporoụzọ Abụja - Kaduna. Ndịagha egbughị oge dịka ha wakporo ndị ntọrọ a ma gbuo otu n'ime ha ebe ndi ọzo jị ọnya mgbọ egbe gbaba n'ime ọhia. Etu a ga ha siri were zọpụta ụmụ akwụkwo isii ndia nille ma naputa ndi omekome a otu egbe 'AK-47', mgbo egbe pụrụiche asaa nke "7.62mm" na egbe 'Pump action' na mgbọ iri so ya. Egbe a natara ndị omekome na Kadụna Steeti. Ndiagha a gara n'ihu chebiri ndị ntọro a na Soho Gaya nke dị na okpuru ọchichị Chikun n'ihe dịka elekere nke iri n'ụtụtụ. Nchebiri ndiagha mụtara mkpụru dika ha gburu otu onye omekaome a ma natakwa ha otu egbe rifụl, gbụo ndị omekaome abụọ ma natakwa ha egbe AK 47 abụọ, otu egbe 'Pump action' na mkpo mgbo egbe atọ. Ndị ntọrị anwụrụla ụmụakwụkwọ isii na Kaduna Nwaanyị dị ime so na mmadụ ise a tọrọ na Kaduna Meria kpalịri mụọ ndịagha, ebe onyeisi ndịagha nke 'Commanding Division 1' bụ Major General Faruk Yahaya toro ha ma gbaa ha ume ka ha jisie ike memilaa ndị omekome niile no na mpaghara ahụ. Dịka ọ dị ụgbụa, ndịagha Naịjirịa ka na-achọ ndị ntọ na ndị omekaome n'ime ọhia nke dị na mpaghara ebe ha wakporo ndị ntọrị a. Akụkọ ga-amasị gị Mụ na Buhari? Nke a bụ asịrị A wakpoola ụlọahịa m n'Aba - Jane Ogbuata Mahadum Rivers enyela ụmụakwụkwọ akara ekwentị maka mkpesa ndị na-edina ha Ndịagha Naijirịa anwụchiela otu onye Boko Haram a na-achọ kemgbe 2016 Ihe nkiri ga-amasị gị
[ "Kaduna steeti", "Naijiria", "Ntọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-49977809
Lee ka izu a si gaara ụfọdụ ndị a ma ama na Naịjirịa
Akụkọ a gosiri ihe ụfọdụ ndị a ma ama na Naịjirịa mere n'izuụka gara aga.
2019-10-11T17:39:01Z
Nigerian Celebrities: Lee ka izu a siri gaara ha
Regina Daniels Regina Daniels Ndị a ma ama nke pụtara "celebrities" na Bekee na-ebi ndụ dị iche na nke mụ na gị. Ya mere na dịka izuụka a na-abịa na njedebe anyị ga-eme ngụkọ gbasara ha. Ọgọ ukwu ndị Igbo nwere na mba E nyela Khafi ọsọ n'ụlọ Big Brother Naịja Ngụkọ ga-agụnye ihe mere ha bụ ndị a ma ama na ihe ha mere. Chee aka ghọrọ ya 1. Ụbọchị ncheta ọmụmụ Kelechi Ihenacho 2. Iyke Cindy na Elo nke #BBNaija bịara n'ụlọọrụ BBC 3 Rita Dominic n'ekike jioji pụrụiche 4. Phyno na-enye ekele maka afo ọhụrụ ya 5. John Mikel Obi na ụtọndụ ya na-enweta onwe ha 6. Nne Charly Boy nwụrụ 7. Otiegwu Sky B a nwụrụ ka ọ dị ndụ? 8. Regina Daniels chetara ụbọchị ọmụmụ ya
[ "Nollywood", "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria", "Egwuruegwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50010608
Naanị ụgwọ otu ọnwa ka Naịjirịa ji Gernot Rohr - NFF
Ndị NFF ekwuola na ọ bụ naanị ụgwọ ọnwa Seputemba ka ha ji onye nchịkọta Super Eagles bụ Gernot Rohr.
2019-10-11T17:58:27Z
Super Eagles: Naanị ụgwọ otu ọnwa ka Naịjirịa ji Gernot Rohr - NFF
Akụkọ dị mkpa: Ụgwọ anyị ji Rohr bụ naanị otu ọnwa: Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Nigerian Football Federation' ekwuola na ha ji onye nchịkọta ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr ụgwọ otu ọnwa (Seputemba). N'ozi si n'akara twitter ha pụta sị na ọ bụ naanị ọbụghị ụgwọ ọnwa atọ dịka akụkọ na-efegharị si kwuo. Nne Gernot Rohr alaala mmụọ Burundi na Madagascar bụ elelia nwa ite - Gernot Rohr Otu NFF gara n'ihu kwuo na ha na-agba mbọ ịhụ na a kwụrụ Gernot Rohr ụgwọ a n'egbughi oge 'Anyị chọrọ iwu kajara akaja make ikpuchi ụmụnwaanyị' Onyeisiala Muhammadu Buhari sị na Naịjirịa chọrọ iwu siri ike iji megide mmegbu na mwakpo ụmụnwaanyị na ala. Onyeisiala Buhari kwuru nke a n'ime ụbọchị anọ BBC wepụtara akụkọ nyocha gosiri ndị nkuzi na mpaghara Afrịka na-achọ idina ụmụakwụkwọ. A kpochiela ụzọ Dkt Boniface Igbeneghu na Unilag Buhari nyere ndị ọrụ nchekwa nakwa ndịisi ụlọakwụkwọ ndụmọdụ ka ha gbaa mbọ hụ na a tara ndị na-awakpo ụmụnwaanyị ahụhụ dịrị ha. Ọ sịrị ka ndị mmadụ ghara ịkọ ndị a wakporo ọnụ ma ọ bụ ime ha ihe ihere nakwa ka ezinaụlọ ndị a kwupụta ụdị ọnọdụ a. Nke a bụ okwu mbụ Buhari na-ekwu banyere ụdị ọnọdụ a. Nobel Peace Prize nke afọ 2019 E chiela Abiy Ahmad bụ Praịm mịnịsta mba Ethiopia eze udo nke mbụ dịka o turuugo nrite Nobel Peace Price nke afọ 2019 Echichi a bụ maka mbọ ọ gbara n'ime udo n'etiti mba Ethiopa na Eritrea n'ime ọgbaghaara ruru afọ iri abụọ. Nkeji Kpochapụ mpụ na ohi n'Anambra Steeti Gọvanọ Willie Obiano na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Abubakar Aka na-achị Anambra Steeti bụ Willie Obiano adọọla ndị ekperima aka na ntị ka ha gbaara steeti ahụ ọsọ. Obiano kwuru nke a oge o mepere atụmatụ 'Operation kpochapụ nke abụọ n'ụbọchị Fraịdee. O kwuru na oge agaala mgbe ndị abalịdịehwu na ndị omekome ji Anambara mere ebe obibi. 'Ndị omekome chegharịa ma ọ bụ si Anambra pụọ" John Abang CP Anambra steeti AGịnị mere Anambra ji bụrụ ọkaibe na mwulite obodo? Iji mepee ya bụ atụmatụ, Obiano bunyere ndị uweojii ụgbọala dị otu narị na iri n'otu (111). Ụfọdụ n'ime ụgbọala ndị ahụ bụ nke Innoson Motors mepụtara ebe ụfọdụ si ofesi. Ụgbọala Gọvanọ Obiano bunyere ndị uweojii Obiano kwukwara na etinyela igwe ose foto Bekee kpọrọ CCTV na mpaghara dị iche iche na Ọnịcha, Ọka nakwa Nnewi. N'okwu ya, "igwe ose foto ndị na-ahụ ụzọ ruo ihe karịrị ama egwuregwu bọọlụ anọ". "CCTV ndị ahụ nwekwara ike iseta mmadụ ma n'ime abali." "Ụgbọala ndị ahụ nwekwara akụrụngwa dị icheiche n'ime ha nke ga-enye aka inwude ndị ekperima n'otu ntabi anya." Buhari ekeleela onyeisiala mba Ethiopia Onyeisiala Muhammadu buhari eburula ụkpa ekele bugara onyeisiala mba Ethiopia bụ Abiy Ahmed. Nke a bụ maka nzere 'Nobel Peace prize' bụ nke e nyere Ahmed n'ụbọchị Fraịdee Ahmed ritere nzere a n'ihi mkpezi udo o wetara n'etiti mba Ethiopia na Eritrea. Buhari kwuru na ọ ga-amagbu onwe ya ma mba Afrịka niile bụrụ ndị na-achọ maka udo. Naịjirịa na P&ID Abubakar Malami, ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti. Gọọmentị etiti akwụọla ụlọọrụ P&ID ego dị pound puku narị abụọ na puku iri ise (£250,000) dịka ụlọikpe na London si nye iwu. Mana onye ọkaiwu nke Naịjirịa bụ Dayo Akpata gwara ndị ntaakụkọ na a ga-akwụghachi Naịjirịa ego ahụ ma ha merie ya bụ ikpe. Nigeria na ụlọọrụ P&ID agala ikpe udo na UK Naịjirịa ka na-agba lịkalịka ịtụgharị ikpe ekpebiri na London n'oge gara aga nke na-ekwu ka ha kwụọ ụlọọrụ P&ID ijeri dọla itoolu na ụma isii n'ihi nnupu isi na nkwekọrịta ha nwere n'afọ 2010. Na Liberia Onyeisiala Liberia bú George Weah Ndị uweojii mba Liberia emechiela ụlọọrụ ntaakụkọ redio a kpọrọ roots FM n'ike n'ihi ebubo na ha enweghị akwụkwọ ikike. Ndị nwe ụlọọrụ ahụ kwuru na ha nwere akwụkwọ ikike kama na mmechi ahụ bụ maka na ha na-akatọ ọchịchị aka ike onyeisiala George Weah. Belgium alaferela Lukaku enyela goolu anọ n'asọmpi atọ ọ gbaara ndị Beljum Mba Belgium ji ọkpụ goolu itoolu wee supee SanMarino n'asọmpi ha gbara ụnyaahụ iji bụrụ ndị mbụ tozuru oke isonye na egwuregwu Euro 2020. Romelu Lukaku nyere goolu abụọ n'asọmpi ahụ, ebe ndị ọzọ dịka Christian Benteke nakwa Nacer Chadli nyekwara goolu. Ịngland na Check Repọblik ga-ezute n'abali taa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ọfala ga-amalite n'uju taa Onye bụ Sadiya Umar Farouq? A wakpoola ụlọahịa m n'Aba - Jane Ogbuata
[ "Naijiria", "Ikike ụmụnwanyị", "Anambra Steeti", "Ụmụnyanyị", "Muhammadu Buhari", "Liberia" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50025391
NNPC ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ugwu Naịjirịa
Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere nkwado ka amalite nchọpụta mmanụ agbidi na mpaghara Gongola Basin n'ọnwa Febrụwarị afọ a.
2019-10-12T05:38:23Z
Oil Exploration: NNPC ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ugwu Naịjirịa
Ebe a na-amịpụta mmanụ agbidi Mpaghara ugwu Naịjirịa esorola na mpaghara na-emepụta mmanụ agbidi. Ụlọọrụ na-ahụ maka mmepụta mmanụ agbidi na Naịjirịa bụ 'Nigeria National Petroleum Corporation' kwuru na ha ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ahụ. Naijiria kachasị atụbata mmanụ n'ụwa 'Anyị nwere mmanụ ụgbọala ga-ezuru unu ' - NNPC Ha kọwapụtara nke a n'akwụkwọ ozi nke ha wepụtara na mgbede Fraịde. Ebe a chọtara mmanụ ahụ bụ na osimiri Kolmani nke dị na Gongola Basin, na mpaghara ọwụwa anyanwụ ugwu nke Bekee kpọrọ 'North East'. Dịka akwụkwọ ozi ahụ si kwuo, ọbụ n'abalị iri nke ọnwa Ọktoba ka ndị ọrụ NNPC gwupuru ụmị ebe a hụrụ mmanụ agbidi ahụ nakwa ikuku gaasị. Onye binyere aka n'akwụkwọ ozi ahụ bu Samson Makoji, onye isi ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta NNPC na ndị ọha obodo. Mele Kolo Kyari bụ onyeisi ụlọọrụ NNPC Makoji kwuru na ụmị ahụ ha gwupuru nwekwara nke Bekee kpọrọ 'condesate' na 'light sweet oịl'. A na-emezi nnyocha ugbua iji chọpụta ole mmanụ dị n'ụmị ahụ ha, ma ọ ga-erukwa nke a ga-ere ere n'ahịa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Mụ na Buhari? Nke a bụ asịrị Gịnị ka ndị a ma ama mere n'izu a? Azọpụtala ụmụakwụkwọ ndị ntọ tọrọ na Kaduna steeti
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "United Kingdom", "Naijiria", "Egwuruegwu", "Donald Trump", "Amerika", "Bọọlụ", "Bauchi Steeti", "Akụ na ụba", "Gombe steeti", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50025393
Ị wakpo nwaanyị maọbụ ụmụaka, anyị a pịa gị amụ - Ụlọomeiwu Ekiti
Ụlọọmeiwu n'Ekiti steeti na-atule iwu ọhụrụ iji gbochie oke mwakpo ụmụnwaanyị nakwa mmetọ ụmụntakịrị.
2019-10-12T08:42:29Z
Sexual Offences: Ị wakpo nwaanyị maọbụ ụmụaka, anyị a pịa gị amụ - Ụlọomeiwu Ekiti
Bisi Fayemi Nwunye Gọvanọ Ekiti steeti bụ Bisi Fayemi so na ndị na-akwado iwu ọhụrụ a Ụlọomeiwu n'Ekiti steeti na-atule iwu ọhụrụ ha chọrọ iwepụta iji gbochie oke mwakpo ụmụnwaanyị na mmetọ ụmụntakịrị. Iwu a na-ekwu na onye ọbụla a mara ikpe gbasara mwakpo na mmetọ ụmụnwaanyị, a ga-apị ya amụ. Iwu a bụ nke a kpọrọ 'Gender-based Violence (Prohibition) Amendment Bill' na Bekee. Nwaanyị manye nwoke ka ya na ya nwee mmekọrịta, ọ bụ mwakpo n'ike? Ihe ise nwaanyị ga-eme iji nweta ikpe ziri ezi ma a kwaso ya iko n'ike Ị bụ onye mwakpo ụmụwaanyị - Ụlọịkpe Onye bu iwu a n'isi bụ nwunye gọvanọ steeti ahụ bụ Bisi Fayemi N'okwu ya mgbe a na-atule iwu ahụ n'ụlọomeiwu ndị Ekiti, Oriakụ Fayemi kwuru na iwu a bụ iji chekwaa ụmụnwaanyị. O kwuru sị: "A kwadoro m iwu a nke ọma. Ọbụ iji chekwaa anyị na ụmụ anyị nakwa ezinụlọ anyị." "Anyị na-arịọ ụnụ ka ụnụ kwadoo iwu a ma wepụta ya ngwa ngwa." 'Ndịagha wakporo ụmụnwannyị n'ike' N'otu aka ahụ, onye ọkaikpe ukwu nke steeti ahụ bụ Wale Fapohunda kwukwara na ya kwadosiri iwu ahụ ike. Fapohunda kwuru na "mwakpo ụmụnwaanyị na mmetọ ụmụntakịrị na-arịzi ibe ya elu na steeti anyị ugbua." Gịnị bụ ịpị mmadụ amụ? Ịpị mmadụ amụ bụ iwepu mkpụrụamụ abụọ nwoke na-enwe. E mee nke a, nwoke ahụ agaghị enwe ike ịtụnyenwu nwaanyị ime. Amụ ya agaghị enwe ike ịkwụ ọtọ ọfụma n'ihi na ewepụla ihe na-etiri ya egwu. Nke ahụ ga-ebelatakwa agụụ inwe mmekọrịta nwoke na nwaanyị. Mana onye ahụ nwere ike iji amụ ya anyụ maamịrị. Ụzọ ọzọ e sikwa apị mmadụ bụ site n'ịgba ọgwụ. Ọdị ụzọ abụọ e nwere ike iji pịa mmadụ amụ. Nke mbụ bụ iwepụ mkpụrụamụ, ebe nke abụọ bụ site n'ịgba ọwgụ. E nwere ike ịgba mmadụ ọgwụ iji kụnwụọ ihe ndị ahụ na-enye aka maka mmekọ nwoke na nwaanyị. Nke pụtara na onye ahụ agaghịkwa enwe mmasị inwe mmekọ ọzọ. Ipị amụ ọ ga-eme ka mwakpo kwụsị? Ndị e boro ebubo ịwakpo nwata gbara afọ iri na anọ na mba Indoneshia n'afọ 2016. Na mba ụfọdụ n'ụwa, ọ dịkwa ka ịpị amụ enyela aka belata mwakpo na mmetọ ụmụnwaanyị. Mana ọbụ ịgba ọgwụ ka mba ndị ahụ ji ata ndị dara iwu a ahụhụ. Mba ndị ahụ gunyere Poland, Mọldova, Indoneshia, Rọshịa, Saụt Koria, nakwa mpaghara ụfọdụ na mba Amerịka. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: NNPC ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ugwu Naịjirịa Mụ na Buhari? Nke a bụ asịrị Naanị ụgwọ otu ọnwa ka Naịjirịa ji Gernot Rohr - NFF Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ịwakpo mmadu na-ike", "Ikike ụmụnwanyị", "Ekiti Steeti", "Ụmụnyanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50029973
NBA Etiela aka n'obi maka onye otu ha ndị ụweojii kụrụ dukaduka n'Ọnịcha
Ndị Nigerian Bar Association ebidola ịsi imi n'ala ka ha amata ihe mere ndị uweojii ji tinye onye otu ha anyammee n'Onicha.
2019-10-12T19:50:10Z
Anambra Police: NBA sị na ha ga-ahụ isi ya maka dukaduka a kụrụ onye otu ha
Ogbonnaya Obasi Otu jikọrọ ndị okaikpe na Naịjirịa bụ Nigerian Bar Association (NBA) agbarụọla ihu maka onye otu ha ndị uweojii kụrụ dukaduka n'Ọnicha ụnyahụ bụ Fraịda. N'akwụkwọ odeakwụkwọ mgbasaozi ndị otu a bụ Kunle Edun tinyere aka, ndị otu a sị na agwa ndị uweojii ahụ kpasara ya bụ nwaamadị aha bụ Ogbonnaya Jacoab Obasi jọgburu udele ma sigbuo nkakwụ nke bụ na ọ kpụrụ ugwu ha n'ala dịka ndị okaikpe. Ndị uweojii agbagbuola nwa agbọghọ Ihe ndị uweojii kwuru maka nwaamadị agbagburu n'Aba Etu e si gbagbuo ndị uweojii asaa n'Abuja Dịka ọ dere, onyeisi ndị otu a n'Onicha bụ Ozoemena Erinne sị na "ajọ ihe Ogbannaya mere bụ na ọ gara igboọgụ onye ọzọ ndị uweojii ahụ na-eti ihe nke mere ha ji sụọ ya ikeegbe. Ya bụ akwụkwọ sị na onyeisi ndị NBA enyela ikike ka ndị otu ha tinye anya n'ala sowe ya bụ ajọ agwa akpasara onye otu ha. BBC Igbo kwukwara ya bụ nwaamadị bụ Ogbonnaya Obasi bụ onye sị na ya si ụlọogwu ebe ọ gara nyocha ahụ alọta. Obasị sị na ndị uweojii ahụ tiwere ya ihe ebe ya na-arịọ ha biko ka ha kwụsi iti nwoke ọzọ ihe. Ọ si na ya agaghị amata ndị uweojii mere ya bụ ihe maka na ha gbapụrụ ozugbo buru nwaamadị nke ọzọ gbapụ n'ụgbọala ha, mana na ọ nwere ndị na-arịọ ya mgbaghara n'ekwentị mana na ya sị ha bịa ka ya hụ ha anya. Ka ọ dị ugbua, na-akwụkwọ nke ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed sị na obi adịghị onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ John B.Abang mma maka agwa ọjọọ ndị ọrụ ya kpasara Ogbonnaya. Ọ sị na Janga enyela ikike ka malite nchọpụta maka ndị mere ya bụ ihe ma taa ha ahụhụ dịka okwesiri. Ihe nkiri ebe ndị ụweojii na-eti Okaikpe Ogbonnaya Obasi ihe na-efegharị na Soshal midia kemgbe ụnyahụ. Akụkọ ga-amasị sị A wakpoola ụlọahịa m n'Aba - Jane Ogbuata Azọpụtala ụmụakwụkwọ ndị ntọ tọrọ na Kaduna steeti Mụ na Buhari? Nke a bụ asịrị
[ "Naijiria", "Nchekwa ndị ụwe ojii", "National security" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50032211
'Anyị anwuchiela ndị isi Boko Haram 10' - Ndịagha Naịjirịa
Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha anwụchiela ndị isi Boko Haram iri bụ ndị soro wakpo Gwoza n'afọ 2014
2019-10-13T07:38:06Z
Boko Haram: 'Anyị anwuchiela ndị isi Boko Haram 10' - Ndịagha Naịjirịa.
Ndị agha Naijirịa na-ebuzo Boko Haram agha Ndị agha Naijirịa anwụchiela ndị isi otu Boko Haram iri. Ndịagha Naijirịa anwụchiela mmadụ iri ha sị bụ ndị isi otu Boko Haram soro wakpo obodo ndị di na okpụrụ ọchịchị Gwoza nke Borno steeti n'afọ 2014. Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha bụ Aminu llIyasu kwuru nke a n'akara Twitter ha na satụde, na ha nwuchịri ndịa n'ụbọchị Tụzde dịka ha na-agba ọsọndụ maka mwakpo ndị agha na awakpo ha na mpaghara Gwoza. Ndịagha Naijirịa anwụchiela otu onye Boko Haram a na-achọ kemgbe 2016 Buhari ka na-ekwusi ike na Boko Haram enweghịzị ume Aha ndị a aka kpara bụ ShettimaMustapha Umar, Abba Buji, Alhaji Bukar Madu-(KAHID - Onye Boko Haram ọkwa ya dịka nke 'Brigadier General' ndịagha), Ali Hassan (Ukọchụkwụ ha), Alkali Laminu, Bukur Mustapha, Buba Umaru (Eji 'Black Uhuru' mara) ,Madu Nosobe, Mustapha Hussaine na Umar Jeddum. Ha niile si n'ọpkuruọchichị Bama dị na Borno steeti. Nwunye Onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari Ọ gara ezumike na mba Ingland. Nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari awuchiela na Naijiria n'ụtụtụ a dịka ọ gara ezumike na mba Ingland. O soro dị ya gaa mba Saudio Arabia maka haji, ebe ha sitere gawa London, Ingland. Ebe ahụ ka ọ nọrọ nwee ezumuike. Abụzịkwa m 'First Lady' Naịjirịa - Aisha Buhari Kedụ ihe mere ndị Naịjirịa ji achọ Aisha Buhari? Ụfọdụ ndi nwunye gọvanọ biakwara sị ya nnọọ na ọdọ ụgbọelu nke Nnamdị Azikiwe dị na Abuja. O kwukwara n'akwụkwọ ọ depụtara na ya enwela ike i ji bido ọrụ maka nkwalite ahuike ụmụaka, ndị nne na kwa ndị ọzo na arịa ahụ na Naijirịa. N'Anambra steeti Emume 'World Space Week' n'Anambra Steeti. Mịnịstịrị na-ahụ maka Teknụzu na Naijirịa etoola Anambra steeti dịka ọkachasị n'ihe gbasara Sayencị na Teknụzụ. Ọ bụ mịnịsta na-ahu maka Teknụzụ bụ Ogbonnaya Onu kwụrụ nke a na emume 'World Space Week' ma rịọ ka ụmụakwụkwọ tinye ụchụ na agụm akwụkwọ . Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti Agbara nwaanyị ndị si Anambra state Nigeria enweghi ike ichefu N'Ofesi Ndị agha Burkina Faso awuchiela na mpaghara ebe mkpamkpa a kpara Akwa arịrị na-ada na Burkina Faso dịka ndị ana amaghi ndị ha bụ banyere n'ụlo ndị ofufe Alakụba were gbuo mmadụ iri na ise ebe mmadụ abụọ merụrụ ahụ. Onweghị ndị pụtara kwuo na ọ bụ ha kpara mkpamkpa a kama a na eche na ọ bụ ndịagha ọgụ Jihad kpara ya bụ mkpamkpa. N'Egwuregwu Ndị nkwadọ Super Eagles ga-apụta n'Agege Stadium mgbe ha na ndị Togo ga-ezute. Ndị otu super Eagles nọ na Naijirịa na-achọ ọkpu goolu atọ ha ga eji gbapụ ndị nke Togo maka Ntozu asọmpị 'African Nations Championship' nke 2020. Ha ga-enwe ohere a na ụbọchị 19 nke onwa oktober na Legos iji bụkwara mmeri ndị Togo meriri ha na be ha. Ị ma ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles niile? Nigeria agbawala Tunisia aka nachara ha ọlanchara Cheta na ndị otu Togo ji ọkpụ goolu anọ a asatra otu were merie ndị Super Eagles na be ha Ka ọ dị ugbua SuperEagles na achọ goolu atọ ha ga-eji gbapụ ndị Togo na asọmpi a. Akụkọ ga-amasị gị NBA Etiela aka n'obi maka onye otu ha ndị ụweojii kụrụ dukaduka n'Ọnịcha Ụlọ adagbuola mmadụ anọ na Legọs Ị wakpo nwaanyị maọbụ ụmụaka, anyị a pịa gị amụ - Ụlọomeiwu Ekiti NNPC ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ugwu Naịjirịa Ihe nkiri ga-amasị gị
[ "Boko Haram", "Science", "Tekinụzụ", "Naijiria", "Borno steeti", "Anambra Steeti", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50021889
Ka ndị Amaigbo siri mata na King Jaja nke Opobo bụ Mbanaso
Akụkọ a kọwara ka e si tọrọ Mbanaso ,emechere mata dịka King Jaja of Opobo n'Amaigbo dị na Imo steeti, ugbua.
2019-10-13T08:43:53Z
King Jaja of Opobo: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbara afọ 12
BBC Igbo gara Amaigbo ijupụta ụmụnne nwafọ Igbo a ama dịka King Jaja nke Opobo ka ha sị mata na ha na nwa amadị a bụ Nwanne. Ọ rụọla agbụru atọ kemgbe Mbanaso bụ onye amaara dịka Jugbo Jugbo n'Opobo furu. Bekee tụgharịri ya bụ aha kpọwazịa ya Jaja maka na ha enweghị ike ịkpọli Jugbo Jugbo. BBC Igbo na nwa nwanne Jaja bụ Duruoshiri nke abụọ nwere mkparịta ụka na nchete nwaanne ha bụ Mbanaso. Duruoshimiri tọturu anyị abọ ka Nna ya siri kọwaara ha maka Mbanaso na ka esi tọrọ ya, nakwa ka ha sị mata na ọ ka dị ndụ. Ọrụ a sị n'aka Chris Sanctus Okereke.
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50032212
Gini ka ụbọchị 'No Bra Day' pụtara?
I mara ihe emume ụbọchị ịyipụ akpaara pụtara?
2019-10-13T15:05:44Z
No Bra Day: Gini ka ụbọchị a pụtara?
Ọrịa kansa Dịka ọ na-ewu n'ebe niile, ọtụtu ndị mmadu nwere nghọtaghịe ihe ụbọchị a bụ maka ya. Etu ụbọchị a siri Bido Dịka ndị otu Cancer.ca siri kọwaa, ọ bụ Dọkinta Mitchell Brown bịdoro ụbochị a i ji mepee anya ndị mmadụ maka ihe gbasara ọrịa kansa n'afọ 2011. Brown kpọrọ ya 'BRA Day' nke pụtara "Breast Reconstruction Awareness Day". #NoBraDay: Ọ ga-akwụsị ọrịa kansa n'ụmụnwanyị? Ebum n'obi Brown bụ ị kụziri ụmụnwaanyị ndị a ga-awa ara maka ọrịa kansa na ha nwere ikike ị sị ka awa ha ara ma meekwa ya ka ọ dị mma . Nke a ka ndị Bekee na-akpọ 'Reconstructive Surgery'. Afọ atọ ka ọ were ka emume a gazụọ mba iri atọ. Ka oge na-aga ka atụghaghịrị aha ụbọchị a site na BRA DAY ọ bụrụzia No BRA Day, nke mere ka ọtụtu ndị mmadụ aghọtaghe ya. Ọ na eme Nwoke na Nwanyị kama ọkacha eme ụmụnwanyị ebe ihe pekarịrị 1% n'ime ụmụnwaoke (Dika Nna Beyounce Knowles bụ Mathew Knowles) otu narị na-enweta ya. Otu ihe ikwesiri ime i jị gbochie Kansa Ara Ịchọpụta n'oge Enwere ụzọ abụo esi achọpụta ma mmadụ enwere Kansa ara. Nke mbụ bụ i ji aka gị nyọcha ma pịa ara gị 2. Nke abụọ bụ ịga ụlọ ọgwụ ka ha nyocha ara gị Nwaanyị ji igwe kọmpụta enyocha ara maka kansa Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ụbọchị taa Nwaada a na-akọwa na ọ bụ ụbọchị maka Kansa Ara na ọ bụghị maka ịgba ọtọ Nwaada a na-egosi ụmụnwanyị etu ha ga-esi nyocha onwe ha maka kansa ara. Akụkọ ga-amasị gị 'Anyị anwuchiela ndị isi Boko Haram 10' - Ndịagha Naịjirịa Ụlọ adagbuola mmadụ anọ na Legọs Ị wakpo nwaanyị maọbụ ụmụaka, anyị a pịa gị amụ - Ụlọomeiwu Ekiti NNPC ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ugwu Naịjirịa Ihe nkịrị ga-amasị gị
[ "Awaa etoo", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50035291
Aisha Buhari abatala n'ike na ebube
Ọṅụ juputara ndị mmadụ obi ka Aisha Buharị batara Naịjirịa n'isiụtụtụ Sọnde
2019-10-13T17:39:59Z
Aisha Buhari abatala n'ike na ebube
Aisha Buhari abatala Aisha Buhari Nwunye Buhari na-ekwukarị uche ya n'ihe gbasara ọchịchị di ya Ka gọmenti etiti gbaghachara kepukepu sị na Onyeisiala Buhari chọrọ ịlụ nwaanyị ọzọ, Aisha Buharị abatala n'ike na ebube na njem ọmere na mba UK kemgbe ọnwa abụọ. Eh, anyị nụkwara na ọṅụ juputara ndị enyi na ikwu na Ibe bụ ndị kweere ya egwu mama anata oyoyo. 'Aisha Buhari kwuru okwu ndị karịị mkpa' Akatọghị m mwepụ Onnoghen - Aisha Buhari Ọ gịnị mere Aisha Buhari ji eti mkpu? Aisha hapụrụ Naịjirịa n'ọnwa Ọgụstụ gawa haji na mba Saụdi Arabịa bụ ebe o si soro dị ya gawa London bụ ebe ọ nọ rụọ ụnyahụ. Akụkọ na-ekwu na ọ bụ ezumike dọkịnta ya nyere ya mere o ji gawa ya bụ njem. Ndị zutere ya ka ọ batara na Nnamdi Azikiwe Internationmal Airport bụ nwụnye ndị isiala mbụ na nwụnye ndị gọvanọ ndị ka na-achi ugbua. Okwuru na ụgbụa ya batara na ahụike, na ya adịla njikere maka ọrụ inyere ụmụaka na ụnwanyị ndị ogbenye aka. No bra day Ụmụnwaanyị ekwesighị iyi akpa ara pụta n'ụzọ taa. Taa bụ No Bra day na olu Bekee bụ ụbọchị emepụtara iji tinye uche ụmụnwaanyị maka igbochi ọrịa Cancer. Ma gị buru n'uche na BRA ahụ pụtara Breast Reconstruction Awareness Day. Ọ bụghị nke akpaara. Gụọ akụkọ a n'uju ebe a. Gini ka ụbọchị 'No Bra Day' pụtara? Egbuola onyeisiojii ọzọ na Texas Atatiana Jefferson N'ofesi, ndị uweojii agbagbuola Atatiana Jefferson na Texas. Ndị uweojii akpọrọ ka ha bịa mata mkpọtụ na-eme n'ụzọ be ha sị na ha chere na nwaagbọghọ ahụ dị afọ iri abụọ na asatọ chọrọ ịgba ha egbe. Onye agbata obi nwa ahụ egburu sị na ya nụru mkpọtụ na-eme na ụzọ nwaagbọghọ ahụ nke mere o ji kpọọ ndị uweojii. Ndị uweojii sị na mgbe ha na-agagharị na-enyo anya na ugegbe mpio mkpuru ebe nwa ahụ nọ, na ha hụru onye na abịa nso nọ n'ime ụlọ ahụ were chere na ọnye ahụ bịa ịwakpo ha were gbakanyere ya egbe. Mana ọkaikpe nwaagbọghọ ahụ na-ekwu na ọ na agba okwe na TV n'ime mkpuru ha mgbe ọ nụrụ mkpọtụ ndị ụweojii ahụ gazịa nyoo ka ọ mata ndị nọ ebe ahụ. Naịjirịa na Brazil apịala nku Renan Lodi na Alex Iwobi na-achipụ ya na asọmpi enye na enyi nke Naijirịa na Brazil gbara ụbọchị Sọnde na Singapọ N'egwurewgwu, Naịjiria na Brazil agbaala onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ n'asọmmpi enye na enyi ha gbara taa na Singapore. Joe Aribo nyere ndị Naịjirịa goolu ha na nkeji 35" ebe Casemiro saara Brazil ya bụ goolu na nkeji 48", ka alatachara ezumike. Chi Super Eagles zọọrọ ha ka odogwu Real Madrid a bụ Casemero chọrọ itinye goolu nke abụọ ya na goolu mana ya bụ anụ gbanahuru ya ma okwoghị ya nke bụ ọdụ. Ọkpa nkọ Brazil ji eje mba so sọọ ya bụ mpi bụ mmadụ dịka Philipe Coutinho, Gabriel Jesus, Roberto Firmino nakwa ochie dika dịka Dani Alves. Mana ndị a niile achịtaghị aja n'ihu Super Eagles maka na ha ji nku ha pịanye ha ajụ n'anya. Cheta na Brazil ji ọkpụ atọ asataghị otu pịajie Super Eagles nku mgbe ha gbara bọolụ nke ikpeazu na National Stadium, Abuja. Asọmmpi enyi na enya a agbara ka onye nkuzi Super Eagles bụ Gernot Rohr sị na ọ bụ ya ka ya ji akwado maka asọmmpi iko mba Afịka na-abịanụ. N'ụlọ ọrụ nnọchite anya mba Brazil dị na Legọs, ndị nkwado Super Eagles buru egwu na ịgba ga ikiri ya bụ bọolụ ebe ahụ. Ndị ọrụ BBC sochiri ha azụazụ ebe ahụ ịwetere unu ka o sị gaa. Ndị nkwado egwu bọolụ Super Eagles na embasi ndị Brazil Ndị nkwado egwu bọolụ Super Eagles na embasi ndị Brazil Gee akụkọ ndị aniile n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị Ị wakpo nwaanyị maọbụ ụmụaka, anyị a pịa gị amụ - Ụlọomeiwu Ekiti NNPC ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ugwu Naịjirịa Lee ka izu a si gaara ụfọdụ ndị a ma ama na Naịjirịa
[ "Brazil", "Naijiria", "Canada", "Amerika", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa", "Ahụike", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50035292
Otu nwoke adaala nwụọ na ọdọugbọelu dị na Legọs ka ọ nụrụ na nwunye ya nwuru
Otu nwoke na-eme njem ekoropula nwụọ ka ọ nụrụ na nwunye ya nwuru
2019-10-13T19:35:48Z
Otu nwoke adaalụ nwụọ na ọdọugbọelu dị na Legọs ka ọ nụrụ na nwunye ya nwuru
Murtala Mohammed Airport Lagos Murtala Mohammed Airport Lagos Arụ mere ụnyahụ bụ Satọde ka otu nwoke onye Naịjirịa na-eme njem na mba France dara nwụọ mgbe ọ natara ozi na nwunye ya nwuru. Nwaamdị a akwụọla na ahịrị ịbanye ụgbọelu oji efepu mba ofesi mgbe ọ nwetere ozi a. FAAN enyopuola nwoke ahụ rịrị elu ụgbọelu na Lagos Ebola: Lee ihe FAAN ga-eme ndị si mba ofesi abata Naịjirịa Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na MMIA bụ DSP Joseph Alabi gwara BBC na ngwa ngwa ya bụ nwoke dara n'ala ka ha buru ya gawa ụlọọgwụ mana ọ mechere nwụọ n'ebe ahụ ụnyahụ. Alabi sị na ya bụ ọdachi a mere ihe dịka elekere ise nke mgbede bụ mgbe e jiri buru ya ozigbo gawa ụlọogwu dị na Ọdọugbọelu ahụ bụ ebe dọkịnta Bekee nọ ebe ahụ bụ Ajayi Olamide kwuru na ya bụ nwaamdị ekubiela. Ozu nwaamadị ahụ amatabeghị aha ya nọ n'ọbaozu dị na Air Force Hospital ugbua. Akụkọ ga-amasị gị Ị wakpo nwaanyị maọbụ ụmụaka, anyị a pịa gị amụ - Ụlọomeiwu Ekiti NNPC ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ugwu Naịjirịa Lee ka izu a si gaara ụfọdụ ndị a ma ama na Naịjirịa
[ "Legọsị", "Naijiria", "Njem ụgbọelu", "Mberede njem ụgbọelu", "Legọsị steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50025394
Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n'Ebonyi State
Ebonyi steeti bụ steeti a na-eche na ha kachasị daa ụbịam na mpaghara ọwụwa anyanwụ mana ha nwere ihe ọnatarachi nwere ike ịba ha ọgaranya.
2019-10-14T05:20:12Z
Ebonyi State: Lee ihe akụ ọnatarachi juputara na steeti a
Galena Galena Nchọpụta kwuru na Ebonyi steeti so na steeti kacha daa ụbịam na Naịjirịa, mana nke ahụ nwere ike ịgbanwe n'oge na-adịghị anya. Nke a bụ maka na steeti ahụ nwere ọtụtụ ihe akụ ọnatarachi nke ha nwere ike ileba anya na ya iji bugharịa ọnọdụ obodo ha. Ụmụnwaanyị Ebonyi state Nigeria enweghi ike ichefu aha ha Ihe mere Ebonyi state ji bụrụ "elelịa nwa ite" Ka anyị leba anya na ụfọdụ n'ime ha dịka 'Raw Materials Research & Development Council' si kwupụta: 1) 'Nnu (Salt)' Ebọnyị nwere oshimiri ndị gbara ya gburugburu nke nnu bara ụba n'ime ya. Ụmụnwaanyị ndị ime obodo n'Ebọnyị nwere ụzọ ọdịnala ha si ewepụta nnu n'ime mmiri oshimiri. Mana ọ dịịrị gọọmentị ileba anya ịmata ụzọ ọgbara ọhụrụ nakwa Teknụzụ nke nwereike ime ka mmepụta nnu bawanye ma na-ewetawanye nnukwu ego. Nnu bara ụba na mpaghara Afikpo North nakwa Ohaozara. Ewepụ na e ji nnu esi nri, ihe ndị ọzọ ejikwa ya eme buru ibu. Ha gụnyere nke bekee kpọrọ 'dyeing' na 'bleaching' dgz. 2) 'Galena' Galena Galena bụ okwute ojii a na-egwupụta n'ime ala. Ọ na-adị ka nke bekee kpọrọ 'lead', mana ya na 'lead' abụghị otu ihe. A na ahụkwa kịrịrị ọla ọcha n'ime Galena, nke mere ọnụ ahịa ji adị elu. Mgbe ndị Ebonyi mepụtara omenala Igbo A na-ere otu tọn Galena otu puku dọla, narị asaa na iri abụọ. E ji 'Galena' arụpụta ihe na-enye ụgbọala maọbụ igwe ekwentị ike nke a kpọrọ 'battery' Akụkụ Afikpo North na South nwere Galena n'ụbara. 3) 'Limestone' Igwe e ji akwọri 'limestone' Limestone bụkwa nkume ọcha e ji emepụta ntụ e ji arụ ụlọ nke Bekee kpọrọ 'cement'. E jikwa ya emepụta 'Marble'. O juru eju na mpaghara dị iche iche n'Ebọnyị. Ha gụnyere, Abakiliki, Ishielu, Afikpo North na South, nakwa Ohaozara. 4) 'Granite' Granite bụ nkume siri ike na-acha ọcha. Mana enwekwara ụdị granite na-eji oji. Ọ bụ ịrụ ụlọ, akwa mmiri, nakwa ịchọ ụlọ mma ka e ji ya eme. Ị gaa na mpaghara Ivo, Ọnicha, Afikpo, Ebonyi nakwa Ohaozara, ebe ahụ ka e nwere granite n'uju. 5) 'Marble' E ji 'marble' achọ ụlọ mma dị ọgọ Marble bụ nkume na-esi na 'Limestone' dị ọkụ apụta. Ọkụ ala nwere ịkụ ghekpọọ 'limestone' n'ime ala, mezie ya ka ọ ghọọ marble, dịka ndị ọkacha mara si kwuo. E ji marble a arụ ụlọ, jirikwa ya achọ ụlọ mma. E jikwa ya akpụ ihe ọkpụ dị iche iche. Marble na-ada oke ọnụ ahịa. Abakiliki, Afikpo na Ohaozara bụ mpaghara Ebọnyị e nwere Marble. 6) 'Laterite' E ji laterite arụ ụzọ Bụ aja ụrọ na-acha mmeemmee. Ihe e ji ya emepụta dị ọtụtụ dịka ịrụ ụzọ nakwa ịkpụ ihe ọkpụkpụ. E ji ya emekwa nkume pụrụ iche e ji arụ ụlọ nke Bekee kpọrọ 'Bricks. Na mpaghara Afikpo ka a na-enweta 'laterite' nke kacha mma. 7) 'Ball Clay' 'Ball clay' bụ ụdị aja ụrọ na-acha ọcha. E ji ya emepụta nke Bekee kpọrọ 'ceramics'. "Ceramics' bụ ihe e ji emepụta ihe dị ịcheiche dịka efere nakwa iko a chọrọ mma, na-akụwa akụwa. E jikwa ya akpụpụta ihe ndị e ji achọ ụlọ mma. Ọbụ n'akụkụ osimiri ka a na-enwetakarị ya. N'akụkụ ụfọdụ n'Afikpo South ka e nwere 'Ball Clay'. 8) 'Shale' 'Shale bụ okwụte ojii si n'aja ụrọ apụta. Ọ bara urunke ukwuu maka mmepụta 'cement', 'ceramics', 'tile' nakwa ịkpụ ihe ọkpụkpụ. A na-agawakọ 'shale' na 'limestone' iji mepụta 'cement' Na mpaghara Ọnịcha ka e nwere 'shale' n'Ebọnyị steeti. Ebonyi bụkwa otu steeti na Naijiria e ji ịkọpụta osikapa mara. Osikapa Abakiliki magburu onwe ya ma na adakwa ụda n'Afrịka niile. Ihe ndị a nwere ike inye aka ka Ebọnyi steeti wulie akụnụba ha. Lee ọtụtụ ihe akụ ọnatarachi juputara n'Abia State nke nwere ike ime ha ọgaranya Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti NNPC ahụla mmanụ agbidi na mpaghara ugwu Naịjirịa Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Ọdị ka chikere", "Naijiria", "Dave Umahi", "Ebonyi Steeti", "Nchekwa ọhịa na anụmanụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50038691
Ọ bụrụ na Gọọmentị daara anyị, anyị adaara ha - Odeakwụkwọ NLC
Odeakwụkwọ ukwu otu NLC ekwuola na ọ bụrụ na gọọmentị welite aka n'ego ndị ọrụ na ha ga-akwụsị abụbụọrụ ha chọrọ ịgba.
2019-10-14T13:29:19Z
Minimum Wage: Ọ bụrụ na Gọọmentị daara anyị, anyị adaara ha - Odeakwụkwọ NLC
Emmanuel Ugboaja bụ odeakwụkwọ ukwu otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC), ekwuola ihe gọọmentị ga-eme ka ndị ọrụ ghara ịgba abụbụọrụ. O sị na atụmatụ ha chọrọ iji akwụ ndị ọrụ ụgwọ opekatampe adịghị mma maka na ọ ga-emegbu ndị ọrụ ogogo ha dị elu. O kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị welite aka na pasentị ego ole ha chọrọ ịkwụ, na ha bụ ndịisi ọrụ ga-ewetu aka ha ala iji mee ka ha nwee nkwekọrịta. N'okwu ya "Mkparịtaụka dịka egwuregwu nkịta, ị daara m, m adaara gị. Ọ bụrụ na gọọmentị welite aka elu, anyị ga-anabata ihe ha kwuru." Ndị otu a na-achọ ka e tinyere ha pesentị iri abụọ na itoolu (29%) n'ego a na-akwụ ndị ọrụ nọ n'ogogo asaa ruo ogogo iri na anọ. Ebe a ga-etinye pasentị iri abụọ na anọ na nke ndị ọrụ n'ogogo iri na ise ruo ogogo iri na asaa. Mana onyeisi otu jikọtara ndị gọvanọ bụ Kayode Fayemi, ekwuola na ndị gọvanọ agaghị akwụli ụdị ego ahụ. A na-atụ anya na gọọmentị na ndị NLC ga-enwe mkparịtaụka na Tuzde 15 Ọktoba, 2019. Akụkọ ga-amasị gị:
[ "International Labour Organization", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ọrụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50045979
Ndị nchekwa ejichiela ndị ntaakụkọ 19 n'afo a
Ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye bụ Amnesty International, ekwuola na mwakpo na ịcha ọkụ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-acha ndị ntaakụkọ ejirila otu ụkwụ karịa ibe ya.
2019-10-14T17:56:16Z
Press Freedom: 'Ndị nchekwa ejichiela ndị ntaakụkọ 19 n'afo a' - Amnesty International
Mgbe emere ụbọchị ndị ntoroobia 'Ndị nchekwa na-eyi ndị ntaakụko egwu na Naijirịa' - Amnesty International Ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye bụ Amnesty International ekwuola na ha achọpụtala na ndị nchekwa Naijirịa na-emegide ndị ntaakụkọ, ọkachasị ndị na-akatọ atụmatụ gọọmentị. Ndị ngalaba a na-ekwukwa na ndị nchekwa Naijiria akpọchiela ihe ruru ndị ntaakụkọ iri na itolu kamgbe afọ 2019 bidoro. N'ime akwụkwọ nyocha ha depụtara ka ụfọdụ ndị ntaakụkọ kwuru na ndị nchekwa tiri ha ihe ma taa ha ahụhụ mgbe ha nwụchiri ha. Ngalaba a na-ahụ maka ikike dịirị onye tụru ndị uweojii, ndịagha na ndị ọrụ ncekwa nzuzo bụ 'Department of State service' (DSS) aka dịka ndi kacha awakpo ndị ntaakụkọ. Ngagharị maka ikike diiri onye Ha kwuru maka Jones Abiri nke ụlọorụ ntaakụkọ 'Weekly Source Magazine' ndị DSS nwụchiri n'afọ 2016, ma jide ya afọ abụọ nọrọ n'elu ya, ha ekweghị ka ya na ndị ezinụlọ ya nwee mmekọ ọbụla. Ndị nchekwa Naịjirịa na-ememina ndị mmadụ mgbe niile - Amnesty International Shell na Eni enweela ajụjụ maka mmanụ agbidi wụfuru 'Amnesty International' (AI) kwuru na ndị DSS nwuchikwara Abiri ọzọkwa na nsonso a maka ebubo na-erijughị afọ. Ha kwukwara na ndị nchekwa wakporo ụlọorụ ndị mgbasaozi nke 'Daily Trust' maka akụko ha depụtara maka mkpamkpa ndị Boko Haram na-akpa na mpaghara ugwu. I jị maa atụ, AI kwuru maka onye ntaakụko aha ya bụ Dadiyata a biara tọro n'ihu ezinaụlọ ya. Dịka ọ dị ugbiua, a na-ebo ndị nchekwa Naijiria ebubo imegide iwu gbasara ikike diri onye. Kama ndị nchekwa Naijirịa na agọ ukwu na aka ha maka ebubo a. 'Ndịagha, ndịọrụ mkpọrọ na-emetọ ụmụaka,ụmụnwaanyị n'ụlọmkpọrọ Naijiria' World Press Freedom day: 'Ndị ntaakụkọ chọkwuru ego nke ha' N'aka nke ọzọ, ndị ngalaba ahụ na-ahụ maka ikike diiri onwe ebidola atụmatụ ha kporo "Freedom of Expression Brief" n'ụbọchị 14 nke Oktoba 2019. Ndị ngalaba ikike diiri onwe dịka ha na-ebido "Freedom of Expression Brief" Ebe a ka ha ka esi na-egosipụta mkpagbụ a na-akpagbu ndị ntaakụko na Naijiria. Akụkọ ga-amasị gị Malaysia a mala ụmụ Nigeria 119 ikpe ọnwụ - Amnesty International Otu nwoke adaala nwụọ na ọdọugbọelu dị na Legọs ka ọ nụrụ na nwunye ya nwuru Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n'Ebonyi State Gini ka ụbọchị 'No Bra Day' pụtara? Ihe nkiri ga-amasị gị
[ "Naijiria", "Ikike diri mmadụ", "Amnesty International" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50045980
'Enweghị ibu ga-esi n'oke ala Naijirịa gafee maọbụ bata' - Hameed Ali
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchekwa oke ala Naịjirịa ekwuola na enweghịzịkwa ibu ga-esi n'oke Naijirịa gafee ruo mgbe ha kpebiri.
2019-10-14T20:01:10Z
Border Closure: 'Enweghị ibu ga-esi n'oke ala Naijirịa gafee maọbụ bata' - Hameed Ali
Hameed Ali Onyeisi ngalaba nchekwa oke ala, Hameed Ali Ngalaba gọọmentị a kpọrọ "Ex-Swift Response" nke mejuputara ngalaba na-ahụ maka nchekwa oke ala bụ (Nigeria Customs Service) na ndị na-ahụ maka nkwabata na nkwapụ (Nigeria Immigration Service, ekwuola na ha agaghị agbape oke Naijirịa tupu ndị mba ha na Naijirịa gbara oke emee ka ha sị kwekọrịta. Ngwa ahịa m ka tọrọ na 'Seme Border' - Onye na-atụbata ahịa Ihe ị maghị maka nwoke Customs jụrụ ịnara akaazụ Ọ bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchekwa oke (Customs) bụ Hameed Ali kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ zutere. Ali kwuru na naanị ihe ha chọrọ bụ ka mba ndị a bido ime ihe ha na Naijirịa kwekọrịtara maka ngafe ibu mgbe Olusegun Obasanjo bụ onyeisiala. A na-enyocha isi onye otu anyị were ọkwa na-abụghị nke ya - Customs Ndị 'Customs' ejichiela anwụrụ ike ruru nde kwuru nde naịra si Ghana abata Naịjiria O kwuru na mgbachi oke ala Naijirịa eritela erere ihe ruru otu ijeri naira na ọma anọ (1.4 billion) sitere na mmachi osikapa na ahịa iwu ndị ọzọ. Hameed Ali kọwakwara na mba Nijee ebidola ime ka ha siri kwekorịta site n'ịmachi ibubata osikapa na Naijirịa. Ndị nchekwa ogige nke 'Ex-Swift Response' N'aka nke ọzọ, onyeisi ngalaba na-ahụ maka nkwabata na nkwapụ bụ Muhammed Babandede kwukwara na ha anwụchiela ụfọdụ ndị mmadụ n'oke ala Naijirịa. O kwukwara na onye na-enweghị akwụkwọ njem agaghị agafe oke Naijirịa. Ndị njem chọrọ ime ngagharịiwe na Port Harcourt 'A machiri ibubata tomato a kwọrọ akwọ na Naịjirịa' - Nigeria Customs Babandede kwuru na ha gbochiri ndị Naijirịa otu nari na iri ise (150) ịhapụ Naijiria makana akwụkwọ ha ezighị ezi, gbochie ndị mmadụ otu puku na otu narị na iri na ọtụ (1,111) ịbata maka akwụkwọ ezighi ezi. O kwukwara na ha ejidela ma chụghachị mmadụ narị asaa na iri abụo na asatọ (728) makana ha enweghi akwụkwọ ziri ezi ma nọrọ na Naijiria. Ọ gara n'ihu kwuo na ha nwụchikwara ndị Pakistan na Nọt Koriya na-esighi n'oke ECOWAS, chụghachị ha ma machie ha ịbata Naijiria ebighebi. Akụko ga-amasị gị Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n'Ebonyi State Ndị nchekwa ejichiela ndị ntaakụkọ 19 n'afo a Gini ka ụbọchị 'No Bra Day' pụtara? Otu nwoke adaala nwụọ na ọdọugbọelu dị na Legọs ka ọ nụrụ na nwunye ya nwuru Ihe nkiri ga-amasị gị
[ "Ịji ego achụ ego", "Naijiria", "Njepụ", "Ecowas", "Ahịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50038687
Anyị ga-ewe dinta 10,000 n'ọrụ ibibi Boko Haram - Gọvanọ Borno steeti
Iji hụ na a gbara mbọ kwụsị Boko Haram, Gọvanọ Bọrọnu steeti bụ ebe ha kacha akpa mkpamkpa na-achọ iwe ndị dinta n'ọrụ.
2019-10-14T20:18:16Z
Boko Haram Insurgence: Anyị ga-ewe dinta 10,000 n'ọrụ ibibi Boko Haram - Gọvanọ Borno steeti
Dinta Gọọmentị Borno steeti na-achọ iwe ndị na-achụ nta n'ọrụ iji buso ndị Boko Haram agha na steeti ahụ. Gọvanọ Babagana Zulum chọrọ dinta puku iri (10,000) n'atụmatụ ọ sị ga-enye aka ibibi ndị Boko Haram. 'Anyị anwuchiela ndị isi Boko Haram 10' - Ndịagha Naịjirịa Boko Haram awakpoola Maiduguri ọzọ 'A ga-agbaghara ndị Boko Haram chegharịrịnụ' Zulum kwuru na o nwetala ihe ruru mmadụ puku abụọ si na mpaghara Ugwu Naịjirịa, bụ ndị dinta ga-enyere ndị agha aka ịluso ndị Boko Haram ọgụ. Isa Gusau bụ otu n'ime ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ Zulum, gwara BBC Newsday sị "Dinta ndị a si na mpaghara dị iche iche n'ugwu. Ihe gbasara oke ọhịa dị iche iche doro ha anya nke ọma. "Gọvanọ Zulum na-eche na ọ ga-aka mma itikọta atụmatụ dị iche iche iji alụ agha a. Ndị dinta a ga-enyere aka n'igosi ụzọ". Cheta na agha Boko Haram a malitere kemgbe afọ 2009 ataala isi ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ. Amnesty International ebola ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ebubo mmegbu ọzọ Ndị ngalaba ikike diiri onwe dịka ha na-ebido "Freedom of Expression Brief" Ngalaba na-ahụ maka ikike dịirị onye bụ Amnesty International, ekwuola na mwakpo na ịcha ọkụ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-acha ndị ntaakụkọ ejirila otu ụkwụ karịa ibe ya. Ha kwuru sị na ọ kacha njọ ebe ndị na-anaghị atụ ụjọ ịkatọ gọọmentị nọ, nke mere na a nwụchiela ihe ruru ndị ntaakụkọ iri na itoolu kemgbe mbido afọ a. Mana ndị ọrụ nchekwa agọrọla ụkwụ na aka ha kwa mgbe gbasara nke a. Gụọ maka ya n'uju ebe a: Ndị nchekwa ejichiela ndị ntaakụkọ 19 n'afo a Sịnịgal emeriela WAFU Youssouph Badji nyeere Sịnịgal goolu n'egwuregwu ikpeazụ ha ji bulie iko a Sịnịgal meriri Gana iji maburu iko asọmpi Wafu bụ asọmpi ndị mba si mpaghara west afrịka, nke afọ 2019. Otu abụọ a gbaburu onye laba onye laba ka ha abụọ nyere otu goolu n'ime nkeji 90 tupu ọ banye na penariti nke 'gbaa ka anyị laa'. Naịjirịa bịakwara asọmpi a, mana obodo Cape Verde mere ha Aaron gba aka ka ha ji penariti gbapụ ha n'agba anọ nke ikpeazụ. '#NoPantDay' na-ewu Gịnị bụ nke a? N'ụbọchị 13 nke ọnwa Ọktoba 2019, e mere "#NoBraDay" iji kwuputa maka ọrịa akpụ nke ara. Mana ugbua, ndị mmadụ na-ekwuzi ka ụmụnwaanyị ghara iyi drọs n'ụbọchị 14. Lee ụfọdụ ihe ha kwuru: __mrjoe jụrụ kedụ ọrịa akpụ nke kpatara a ga-eji ghara iyi ọbante? Malaysia amaala ụmụ Naịjirịa 119 ikpe ọnwụ - Amnesty International Ụmụ Naịjirịa dị mmadụ otu narị na iri na itoolu (119) ka a marala ikpe ọnwụ na mba Malaysia maka ibu ọgwụ ike. Nke a bụ dịka otu 'Amnesty International' si depụta n'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'ụbọchị Mọnde. Ndị na-arụ ọgwụ ike agbarụọla mmiri ala n'Enugwu Saudi Arabia na mba ndị ọzọ ga-egbu mmadụ maka ọgwụ ike 'Abu m 'ganja man' tupu m chịsa ọwa' AI bụ otu a ma ama n'ụwa ọrụ ha bụ iwulite ikike dịịrị onye. Ha kwuru na mmadụ dị otu puku, narị abụọ na iri asatọ na otu (1,281) bụ ndị a mara ikpe ọnwụ na Malaysia n'ọnwa Febrụwarị 2019. N'ime ndị a, narị ise na iri isii na asatọ abụghị ndị Malaysia. AI kwuru na ihe dị otu a adịghị mma. Otu ahụ chọrọ ka a kwụsị ịma mmadụ ikpe ọnwụ na Malaysia nakwa na mba niile nke ụwa. Abụbụ ọrụ ndị NLC Otu jikọtara ndị ọrụ bekee bụ Nigerian Labour Congress agwala ndị otu ya ka ha jikere ịgba abụbụọrụ n'ụbọchị iri na isii ọnwa Ọktoba. Ha sị nke a ga-eme maọbụrụ na gọọmetị emeghi ihe ha chọrọ banyere ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ. Buhari mee ọsịsọ - NLC "Kee nkwụcha, anyị na-apụ ama" - NLC Mkparịta ụka mbụ ha na gọọmentị nwere mara afọ n'ala nke mere e ji yigharịa ọzọ na Tuzde 15 Ọktoba, 2019. Ndị otu a na-achọ ka e tinyere ha pesentị iri abụọ na itoolu n'ego a na-akwụ ndị ọrụ nọ n'ogogo asaa ruo ogogo iri na anọ. Ebe a ga-etinye pesentị iri abụọ na anọ na nke ndị ọrụ n'ogogo iri na ise ruo ogogo iri na asaa. Mana onyeisi otu jikọtara ndị gọvanọ bụ Kayode Fayemi ekwuola na ndị gọvanọ agaghị akwụli ụdị ego ahụ. A hụla ụmụaka itoolu a tọrọ na Kano n'Ọnicha Ọtụtụ mmadu na-akato oke ogbugbu mmadu ndị uweojii na-eme Ndị uweojii Kano Steeti ekwuola na ha azọpụtala ụmụaka itoolu a tọọrọ na Steeti ahụ dịka akpọ ha gaa Ọnịcha dị n'Anambra Steeti. Kọmishọna uweojii na Steeti ahụ bụ Ahmed Iliyasu gwara ndị ntaakụkọ na ha kpachiri mmadụ asatọ a na-enyo na aka ha dị n'ịtọrọ ụmuaka ndị a. N'ofesi Ihe karịrị mmadụ puku narị etinyela aka n'ịchọ nakwa ịzọpụta ndị mmadụ tọrọ n'ihi oke ifufe na mmiri ozuzo metụtara na Japan na Satọde. Oke mmiri ozuzo a a kpọrọ Typhoon Hagibis bụ nke kacha ọjọọ na metụta Japan n'ime ọtụtụ afọ. N'egwuregwu Onye nchịkọta otu egwu bọọlụ ndị Bulgaria bụ Krasimir Balakov ebola mba Ingland ebuboi ịkpaoke agbụrụ ebe ọ dị ukwuu. Nke a na-abịa dịka Bulgaria ga-ele Ingland ọbịa taa n'asọmpi itozuoke nke Euro 2020. Nkeji Ihe nkiri
[ "Boko Haram", "International Labour Organization", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ụmụaka", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50055795
Ọ bụ gịnị na-ese okwu n'Aso Rock?
Akụkọ esemokwu si n'isi ọchịchị Naịjirịa bụ Aso Rock na-apụta n'etiti nwunye onyeisiala na ndị ezinaụlọ onyeisiala.
2019-10-15T11:25:25Z
Aisha Buhari vs Mamman Daura: Ọ bụ gịnị na-ese okwu n'Aso Rock
Aisha Buhari Nwunye Buhari na-ekwukarị uche ya n'ihe gbasara ọchịchị di ya O nwere ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi otu nwaanyị nọ n'ime ụlọ na-aba mba ka e mepeere ya ụzọ. Ọ pụtara mgbe akụkọ asịrị na-ekwu na onyeisiala Buhari chọrọ ịlụ nwaanyị ọzọ maka na nwunye bụ Aisha anọghị ya kamgbe ọnwa atọ. Abụzịkwa m 'First Lady' Naịjirịa - Aisha Buhari Aisha Buhari agbarụọla ihe maka ihe na-eme n'APC Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-asị na nwaanyị ahụ bụ Aisha na-eti mkpu mgbe ndị ọrụ onyeisiala jụrụ imepere ya ụzọ. N'ihi ya Aisha Buhari apụtala gwa ndị ntaakụkọ na ọ bụ ya nọ n'ihe onyonyo ahụ kama na ọ dịla anya ihe ahụ mere. Ọ sị na ọ bụ nwa nwanne Buhri a na-akpọ Fatima Mamman Daura sere ihe onyonyo a. Ọ gara n'ihu kwuo na onweghi ihe e mere nwaada a n'ihi na ọ bụ nwa Mamman Daura bụ nwanne nakwa onye ndụmọdụ onyeisiala Buhari. Fatima Daura kwetara na ọ bụ ya sere ihe onyonyo ahụ mgbe Aisha Buhari chọrọ ịwakpo ha n'Asọ Rock. Gịnị na-ese okwu? Nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari sị na Fatima nọ na-achị ya ọchị n'ihe onyonyo ahụ o sere n'ihu ndị ọrụ nchekwa ya. O kwuru na ọ bụ maka na onyeisiala sịrị ha kwakọrọ pụọ n'ụlọ ha bi ka nwa ya nwoke kwabanye. Aisha sị na ọ chọrọ ịbanye n'ime ụlọ ahụ mana a gbachiri ụzọ ya agbachi. Mana Fatima sị na ihe onyonyo a bụ ka o gosi nne na nna ya ụdị agwa Aisha kpasoro ya n'oge ahụ. Ọ sị na mkpu Aisha nọ na-eti tụrụ ya egwu na ọ hụtụbeghi ihe dị etu ahụ. Cheta na nke a abụghị mbụ Aisha Buhari na-ekwu okwu banyere mmegbu ọ na-enweta n'Asọ Rock. N'oge gara aga ọ pụtara n'ihe onyonyo kwuo na o nwere ndị nọ n'Aso Rock 'na-akụrụ onyeisiala Buhari egwu ọ na-agba'. Akụkọ ga-amasị gị: Anyị na Buhari ga-edọrịta ụka - Ndị ndu ala Igbo Ndị nchekwa ejichiela ndị ntaakụkọ 19 n'afo a
[ "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ụmụnyanyị", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50055796
Ọgba mbọ: Etu m si bido ịgba mbọ
Innocent Chukwuma bụ aka na-arụpụta ụgbọala nke mbụ na Naịjirịa kọwara etu o si malite njem azụmaahịa ya.
2019-10-15T12:29:54Z
Ọgba mbọ: Etu m si bido ịgba mbọ - Innoson
Innocent Chukwuma e ji Innoson mara, nwafọ Igbo bụ aka na-arụpụta ụgbọala nke mbụ na Naịjirịa kọwara etu o si malite njem ịgba mbọ ya. Ọ gwara BBC Igbo na ọ malitere njem a dịka ndị ọzọ si amalite nke ha. Ọ sị na azụmaahịa mbụ o jiri bido bụ akụrụngwa ọgbatumtum, si na ya banye na nke ụgbọala nakwa tupu ọ banye n'imepụta plastik n'usoro ahụ. Chukwuma sị na ọ bụ ụlọọrụ plastik ya kachasị ukwuu na mba Afrịka niile. N'afọ 2007, o mepere ụlọọrụ a na-arụpụta ụgbọala a kpọrọ 'Innoson Motors'. Ụlọọrụ a na-arụpụta ụgbọala dị iche iche gụnyere nke ndịagha, ndị ọrụ nchekwa, nke e ji eme njem, nke e ji ekpofu ahịhịa dgz. Kirie ihe o kwuru n'uju:
[ "Ịji ego achụ ego", "Naijiria", "Uchu n'ọrụ", "ụlọ-ọrụ Latrik", "Ahịa ụgbọala", "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50038693
Ịgbọ ncha achịpụtala onye omeiwu ụkwụ n'ama
E setara onye omeiwu ahụ n'ihe onyonyo n'ihu ụlọakwụkwọ
2019-10-15T18:01:47Z
Onye omeiwu apụtala ụlọikpe maka ịgbọ ncha na Tunisia
Nwoke na-eche echiche Igbọ ncha edubanyela otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị n'ọnwụnwa na mba Tunisia. A kpụpụrụ Zouheir Makhlouf, bụ onye ụlọomeiwu na mba ahụ e jidere n'ihe onyonyo ka ọ na-agbọ ncha n'ihu ụlọakwụkwọ, ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya. Bukola Saraki akpọọla oku ka gọọmenti bulite "sexual harassment bill" ọzọ A kpochiela ụzọ Dkt Boniface Igbeneghu na Unilag Mahadum Rivers enyela ụmụakwụkwọ akara ekwentị maka mkpesa ndị na-edina ha Makhlouf bụ onye pati Qalb Tounes, gọrọ agọ sị na ọ bụ naanị mamịrị ka ọ na-anyụnye na karama maka ọrịa shuga ọ na-arịa. Ihe onyonyo ahụ e kesara ọfụma na soshal midia mba ha mere ka ụmụnwaanyị mba ahụ malite ikwu maka etu ụmụnwoke si enye ha nsogbu maka nsori, nke ha kpọrọ #EnaZeda. #EnaZeda pụtara "ma mụnwa" n'asụsụ ndị Tunisia. I nwere kaadị njirimara (National ID card)? Ọ bụrụ na oge kaadị njirimara nke Naịjirịa gị agafeela, mara na ị ga-ejide puku naịra atọ ị ga-eji gbata ọzọ ugbua, dịka ngalaba "National Identity Management Commission (NIMC)" na-ahụ maka ya si kwuo. Ọ bụrụkwanụ na o fuola, mara na ọ ga-eri gị puku naịra ise iji nweta ọzọ. Mana ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ "ebe ọ bụ na a kwụghị ụgwọ gbata ya na mbụ, maka gịnị ka a ga-eji malite ịkwụ ụgwọ maka inweta ọzọ?" Oge ọgwụgwụ oge oruola? Ụlọ ebe nwoke na ụmụ ya isii bi na-eche ọgwụgwụ oge, ndị uweojii sị na nke a gbara ha gharịị Ezinaụlọ zoro ezo na-eche mgbe ụwa ga-emebi apụtala ka afọ itoolu gafere. Ndị uweojii mechara chọta nwoke dị afọ iri ise na asatọ nakwa ụmụntorobịa ruru isii gara kwaba n'ime okpuru ụlọ biri na-eche ọgwụgwụ oge n'obodo Drenthe dị na mba Netherlands, ka otu n'ime ha pụtara ịbịa zụrụ mmanya biya. Ọnọdụ Uzoho Ka ọ dị ugbua, amabeghi mgbe aka na-aghọrọ ndị Super Eagles mgbọ bụ Francis Uzoho ga-ahụ ihu poostu anya ọzọ. Cheta na e bupuru ya n'ọgbọ egwuregwu oge Naịjirịa na Brazịl zutere ụbọchị ụka, ka ọ merụchara ahụ. Anyị na Buhari ga-edọrịta ụka - Ndị ndu ala Igbo Ndị gọvanọ nakwa ndị ndu mpaghara ọwụwanyanwụ ekpebiela ị gazute onysisiala Buharị n'ụbọchị Tọzde n'ihi ọkwụ banyere ọ dị mma Ndigbo. Mkpebi ha na-abịa dịka ha nwekwara nzuko n'Enugwu ụnyaahụ. Ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ asaala Magu Ndị Gọvanọ Ọwuwa-Anyanwụ asaala Buhari Onyeisioche ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ bụ gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti gwara ndị ntaakụkọ nke a. Ndị so na nzuko a gụnyere gọvanọ Enugwu Ifeanyi Ugwuanyi, nke Abia bụ Okezie Ikpeazụ, osote gọvanọ Imo bụ Gerald Irona. Ndị ọzọ gụnyere Enyinnaya Abaribe, Victor Umeh, Nnia Nwodo, nakwa ndị isi ụka katọlik na Metọdis bụ Callistus Onaga na Christopher Ede. Uweojii achọpụtala ụlọ ntaramahụhụ ọzọ Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi Ndị uweojii Katsina Steeti achọpụta ụlọ okpukperechị ọzọ ebe ekere ọtụtụ ụmụaka agbụ ma na-ata ahụhụ n'ụzọ dị iche iche na Sabon Garin dị na steeti ahụ. Kọmishọna ndị uweojii bụ Sanusi Buba sị na ọ bụ otu nwoke a kpọrọ Bello Abdullahi Umar nwe ụlọ a nakwa ndị nọ ebe ahụ dị ogogo afọ asaa ruo afọ iri anọ. N'ofesi Mba Amerịka eyiela ndị mịnịsta Mba Turkey abụọ na ndị ọrụ ha egwu ịmachi ha n'ihi mwakpo ndị agha ha wakporo mpaghara ugwu Syria. Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kpọrọ ogbo ya nke Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan n'ekwentị sị ya ka ọgba mbọ mee udo. N'egwuregwu Aha nwafọ mba Pọtugal na-agba bọọlụ bụ Cristiano Ronaldo na-ada ụda maka goolu nke narị asaa ya o nyere ụnyaahụ n'asọmpi ha ndị Ukren gbara ụnyaahụ. Nkeji
[ "Syria", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Amerika", "Turkey" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50045982
'Idemmiri achụbatala agwọ n'ime ụlọ anyị'
Idemmiri achụọla otụtụ ndị mmadụ ọsọ ụkwụ eru ala n'ụfọdụ obodo na Rivas steeti.
2019-10-15T18:18:46Z
Rivers Flooding: 'Idemmiri achụbatala agwọ n'ime ụlọ anyị'
Ide Mmiri Ndị mmadụ bi n'ụfọdụ ebe na Rivas steeti etiela mkpụ rịo ka gọọmentị were ọsọ were ije bịa nyere ha aka dịka idemmiri na-enye ha ọsọ n'obodo ha. Idemmiri enyela ndị bi n'Eke Obinagu Emene ọsọ Idemmiri cherela obodo Umuokpu aka mgba Ọtụtu ndị bi na Rumuokwurushi akwapụla maka mkpamkpa idemmiri na-akpa ebe ahụ. Ka ọ dị ụgbua, ha na-eji ụgbọmmiri abata ma na-apụ n'ụlọ ha. 'Ajọ nsị na ọrịa na-echere anyị aka mgba.' - Favour Ikechukwu Otu nwaanyị bụ Beatrice Offem, onye ụlọ ya dị n'ogige obibi 'Valley of Decision' gwara onye ntaakụko BBC na kamgbe ọnwa Sepụtemba, na ha na-eji ụgbọmmiri eme njem. 'Ndị bi n' ikpere mmiri ọkachasị ndị bịdebere Osimiri Naija gbabanụ ọsọ ndụ' Offem kwuru si "Anyị na-egbu agwọ na anụ ndị ọzọ idemmiri na-ebubata n'ime ụlọ anyị". ' Kamgbe 2016 ka idemmiri mewere anyị ịwa' - Innocent Dominic O kwukara sị "Mmiri a na-erute anyị n'obi, ihe anyị chọrọ bụ ezigbo ọwammiri maka na anyị enweghi ọwammiri ebe a". Mbuze gbawara ụzọ n'Ụmụawụlụ, lee etu o si bido O kwukwara na ha na-akwụ ndị na-akwọ ụgbọmmiri a otu narị naịra iji bufee ha. Ndị ji ụgbọmmiri na Rmumuokwurushi. N'aka nke ọzọ ka ndị bi n'Ahọada, Abua na Ogba Egbema, Ndoni na-ekwu na idemmiri awakpoola ha kamgbe 2017. Joy Brown abọọla ihe ọ kụrụ tupu ha eruo oge ha. Baseme Akio kwuru na idemmiri a na-ebutere ha ọrịa dị iche iche dịka ịba na azụ mgbu. Lee ihe idemmiri na-eme n'ala Igbo ugbua O kwukwara sị na ha ahụbeghị enyemaka gọọmentị. Ndị bi n'Ahọada na-ekwu na id mmiri na-ebutere ha ọrịa dị iche iche. Ihe ndị otu gbatagbata NEMA nwere ikwu Onyeisi ndị otu ọrụ gbatagbata bụ National Emergency Management Authority (NEMA) nke mpaghara Ndịda-Ndịda bụ Ibarakumo Walson, gwara BBC na ha achọpụtala na ọ bụ mmiri ịsọfe oke, enweghị owammiri na oke idemmiri (flash Floods) kacha ebute nsogbu. "N'oge na-adịghị anya, mmiri nwere ike ilo obodo ndị a" - Ibarakumo Walson Walson kwuru na ọ bụru na egwughị ala mmiri, ma rụọkwa ọwammiri, na ndị obodo a ga na-ata ahụhụ afọ niile. Akụkọ ga-amasị gị Ọ bụ gịnị na-ese okwu n'Aso Rock? Anyị na Buhari ga-edọrịta ụka - Ndị ndu ala Igbo Ndị nchekwa ejichiela ndị ntaakụkọ 19 n'afo a Anyị ga-ewe dinta 10,000 n'ọrụ ibibi Boko Haram - Gọvanọ Borno steeti Ihe nkiri ga-amasị gị
[ "Gburugburu", "Naijiria", "Riva steeti", "Klaimet chanji" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50066185
Ndị uweojii Bulgarịa anwụchiela mmadụ isii na-akwado ịkpa oke agbụrụ
Agwa ọjọ a mere n'asọmpi ntozu Europa
2019-10-16T07:15:34Z
Ndị uweojii Bulgarịa anwụchiela mmadụ isii na-akwado ịkpa oke agbụrụ
Ndị nkwado otu bọọlụ Bụlgarịa Ndị nkwado otu bọọlụ Bụlgarịa anwụchịri maka ikpa oke agbụrụ Ndi uweojii mba Bụlgarịa anwụchiela mmadu isii bụ ndi nkwado otu egwu bọọlu Bulgaria maka ikpa oke agbụrụ. Ndị otu bọọlụ Ingland kwụsirị igbe asọmpi maka oke agbụrụ Agwa ọjọ a mere n'asọmpi ntozu Europa ebe ndi Briten ji ọkpụ goolu isii asataghi ma ncha were merie ndị nke Bulgaria. N'Ọnịcha Tanka bu mmanụ ụgbọala awụfuola ma nwuru ọkụ nke bidoro gbawa kamgbe elekere iri na abụo nke oke ụtutụ taa n'Ọnicha. Okụ a gbara ihe ruru awa iri maọbụ karịa Ọkụ a bidoro na 'Upper Iweka' were ruo Ọchanja nke di n'Ọnịcha. Tanka agbara ọkụ n'Ọnịcha Ndị uweojii kwuru na ha amabeghi mmadụ ole ọkụ a rere, mana ha ebusoola ọkụ a ọgụ n'iji menyụọ ya mana ọ ka pere mpe fọrọ. Onweghi onye nwụrụ n'ime ọkụ tanka agbara ọkụ na Legọs Ụgbọala asatọ na ụlọọrụ anọ gbara ọkụ Aga-ebido nnyochaa ụgwọ ọnwandị ọrụ gọọmentị gbalitere 'A ga-enyocha ụgwọ ndị omeiwu na ndi Gọvanọ' - Chris Ngige Gọọmentị Naijiria enyela ikike ka ngalaba na-ahu maka ikwụ ụgwọ bụ 'Revenue Mobilization Commission' ka ha nyochaa ụgwọ a na-akwụ ndi gbalitere n'ọrụ gọọmentị nke gụnyere ndị Gọvanọ na ndị omeiwu. Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ gbasara budget 2020 Buharị ga-ebupute akwụkwọ etu gọọmenti ga-esi mefu ego n'afọ na-abịanụ Ọ bụ minista na-ahu maka ọrụ bụ Chris Ngige kwụru na atụmatu a bụ ụzọ a ga-esi wetuta mmefu gọọmenti na-emefụ kwa afọ. N'Ofesi - Brexit Bọri Johnson na-acho nkwado ndi omeiwu na Ingland Ndị nnọchiteanya Iropịan Ụnion na ndị nke mba Briten ebidola mkparịta ụka maka ọpụpụ Briten na Iropịan Unịon ọzọ. 'A dị m njikere ịhapụ ọrụ a' - Theresa May E nyela iwu ka a kwụsị ụlọomeiwu mba Briten ọrụ n'ike Dịka Briten hiwere ụbochị iri ato na otu nke ọktoba dịka ụbọchi ọpụpụ ha na Iropịan Union, Onyeisiala ha bụ Boris Johnson kwuola na ha ga-apụ 'ụbochi ahụ na-agbanyeghị. Akụko ga-amasị gị 'Anyị amatabeghi mmadụ ole nwụrụ n'ọkụ gbara n'Ọnịcha' 'Biko mepeturu anyị obere ụzọ ibupu na ibubata ngwaahịa anyị' - Ndị ahịa 'Kama m ga-akwụ N3000 maka 'ID card' m were ya taa suya' 'Biko mepeturu anyị obere ụzọ ibupu na ibubata ngwaahịa anyị' - Ndị ahịa Ihe nkiri ga-amasị gị Otu ndị ahịa a kpọrọ South-East Amalgamated Market Traders Association (SEAMATA) arịọla onyeisiala Buhari ka o mepeturu ha ụzọ maka ibupu ngwaahịa ndị ziri ezi. Nke a dị n'akwụkwọ ozi ha degara onyeisiala Buharị ụnyaahụ bụ nke onyeisi ha bụ Gozie Akudolu na odeakwụkwọ ha bụ Alex Okwudili tinyere aka na ya. Ngwa ahịa m ka tọrọ na 'Seme Border' - Onye na-atụbata ahịa Ọnụ ahịa ihe oriri agbadatala? 'Enweghị ibu ga-esi n'oke ala Naijirịa gafee maọbụ bata' - Hameed Ali Ha kwuru na ọnụ ego ngwaahịa ndị emepụtara na Naịjirịa arịala ezigbo elu karịa aka ndị mmadụ. O kwuru na nke a nwereike ime ka ụlọọrụ ha dị iche iche chụọ ndị na-arụrụ ha ọrụ. Ha rịọrọ onyeisiala ka o biko lebanye anya etu a mmechi okeala ndị a ga-esi metụta ezinaụlọ ndị mmadụ na Naịjirịa. Karịsịa ndị na onweghi ka ọ dị bụrụ ha n'ụzọ inwete nri nakwa ihe eji ebi ndụ. Abụbụ ọrụ agaghịzị amalite taa Nke bụ eziokwu bụ taa bụ na otu jikọtara ndị ọrụ oyibo sị na ha agakwaghị agba abụbụ ọrụ ha chọbụrụ ịmalịte taa. Otu a sị na mkparịtaụka ha na gọọmentị ga-aga n'ihu taa maka ụgwọ opekatampe iji kapịa okwu a ọnụ. Erdogan e cheleara Amerịka aka mgba N'ofesi, Onyeisiala mba Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan akpọọla ekwo nkụ na ya ga ebuso Syria agha agbanyeghị aka na ntị mba Amerika dọrọ ha. Cheta na Amerịka kwakọọrọ ndịagha ha pụọ n'okeala ahụ bụ ebe ndị Kurd na Syria na agwọkọrịta onwe ha ji mmanụ kemgbe. Mmeru ahụ David de Gea bụ ọghọm dịịrị Manchester United Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji Akụkọ ga-amasị gị Ọ bụ gịnị na-ese okwu n'Aso Rock? 'Idemmiri achụbatala agwọ n'ime ụlọ anyị' Ịgbọ ncha achịpụtala onye omeiwu ụkwụ n'ama
[ "I gosi ahịa", "Naijiria", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Ahịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50066186
Mama dị afọ 104 ji ọrụugbo zụọ ụmụ ya
Mama nnukwu Jessie Onuigwe dị afọ 104 kọwara etu o si were ịkọ ugbo zụọ ụmụ anọ ya.
2019-10-16T09:21:43Z
World Food Day: Mama dị afọ 104 ji ọrụugbo zụọ ụmụ ya
Mama nnukwu Jessie Onuigwe bụ onye ọrụugbo si n'obodo Akabọ Osumenyi dị n'Anambra Steeti kọwara etu o ji were ọrụugbo zụọ ụmụ ya anọ. Ọ sị na ọ bụ ọrụugbo a mere ahụ ji sie ya ezigbo ike dịka ọ nọ afọ otu narị na anọ ugbua. Mama Jessie sị na ọ mụrụ ụmụ anọ na ụmụụmụ otu narị na iri abụọ na anọ. O kwuru na ọ bụ ịkọ ugbo ka o ji malite ụwa bụ nke nyere ya ego o ji zụọ ụmụ ya. Ada ya nwaanyị bụ Patience Uzoma Oguine dị afọ iri asaa na asatọ sị na di mama Jessie bụ nna ya nwụrụ mgbe ọ dị obere. Na ọ bụ mama zụpụtara ha ruo mgbe ha tolitere lụọ dị. Ọ sị na a mụrụ mama Jessie Onuigwe n'afọ 1915. Mama Jessie gara n'ihu kwuo na ọ bụ iri nri Ndigbo na ikpere 'Jesus' mere o ji gbasie ike. Kirie ihe o kwuru n'uju.
[ "Okike", "Naijiria", "Ikike ụmụnwanyị", "Anambra Steeti", "Ọrụ ugbo", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50067057
'Ndị a ekwekwala ihe mere na France mee na Naịjirịa'
Ndị mmadụ na-eche maka uru bọda gọọmenti etiti mechiri bara. Ebe ụfọdụ na-eche na ọ dị mma, ụfọdụ na-eche na ọ gaghị egbo mkpa ọbụla.
2019-10-16T12:12:27Z
Nigeria Boarder Closure: 'Mmechi bọda agaghị egbo mkpa ọbụla' - Cosmas Maduka
Kirie ihe Cosmas Maduka, ọnye a ma dịka Coscharis kwuru maka mmechi oke ala ebe e si ebubata ngwa ahia. Maduka sị na ndị ọchịchị nọtere aka ebe ndị ha na-achị nọ nke bụ na ha amaghị nke bụ eziokwu na ndụ ha. Kirie ihe onyonyo a ka ị nụ okwu ya n'uju. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
[ "Ecowas", "West Africa", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50067056
Ụfọdụ nri ndị Igbo anaghị erikawazị
Ihe a bụ nrị ndị Igbo ụfọdụ anaghị ahụkebezị.
2019-10-16T13:06:19Z
World food day: Ụdọdụ nri ndị Igbo anaghị erikawazị
Agbụgbụ na ji Agbụgbụ maọbụ fịọ fịọ Agbụgbụ maọbụ fịọ fịọ na ji agwọrọ agwọ Nri a bụ agbugbu ma ọ bụ fịọ fịọ dịka ụfọdụ sị akpọ ya. Ọ na-adị ka agwa mana ọ bụghị agwa. Lee nri ogbenye 10 ọgaranya na-erizi Nutrition: Oke ibu abụghị na ahụ dị nwa gị Etu ị ga-eji gbanarị iri nsị nri Ị gwọ fịọ fịọ na ji, ịtabiri aka. Ị nwekwara ike itinye ya ụkpaka. Akụ mkpụ Akụ mkpụ Nke a bụ akụ mgbu. Akụ mgbu bụ ezigbo nrị mgbe gboo. Akụ na-ada n'udummiri. N'abali ka ọ na-adakarị. Lee ihe nkiri Mmiri zochaa n'abali, ndị mmadụ eburu ọkụ pụọ n'ezi, gbanye mmiri n'ọba. Dọwa ọkụ n'akụkọ mmịrị ahụ ka ọ na-adọta akụ ahụ. Ọtụtụ akụ ahụ adanye na mmiri ahụ. A na-eghe ya eghe n'ọkụ tinye ya nnu. Ị nwere ike ịta ya otu ahụ maọbụ were ya taa abacha, Ọ na-atọwa ntị. Ighu Ighu Nke a bụ ighu maọbụ iwu ka ụfọdụ sị akpọ ya. Ọ dịka abacha mana ọ bụghị abacha. Ịghụ na-atọchị ntị ma ejiri agbụgbụ maọbụ fịọ fịọ kwọọ ya. Achichi ede Achịcha Achịchị bụ ede eberiri eberi gbaa ya n'anwụ. Ihe a bụ ụzọ ndị Igbo si echekwa nri maka ụnwụ. Mgbe ụnwụ ka e ji eri achịcha mgbe gboo. A na-ejikwa agbụgbụ maọbụ fịọ fịọ agwọ ya tinye ya akwụkwọ ụgbọghịrị. E nwere ọtụtụ ihe e ji ede esi. E nwere nke ana akpọ ede mmachu, ya bụ ede agwọrọ agwọ. Nwekwaa nke bụ ede eko, ya bụ ebe ahụrụ n'ọkụ e ji mmanụ na akpaka eri. Ọ na-atọchi ntị. Anyụ Anyụ Anyụ bụ ezigbo nrị. Ọ na-amịkarị n'udummiri. Ọ na-atọ n'ụbụrụ ma e jiri ji gwọọ ya. Akịdị Akidi Nke a bụ akịdị. A na e ji ji agwọ ya. E nwere ike isi ya mgbe ọ dị ndụ. Nwekwa ike ịchekwa ya n'anwụ maka ụnwụ. Ero Ero Leekwa ero. Ero na-atọ ụtọ n'ofe. E nwere ọtụtụ ero dị iche iche . Ụfọdụ n'ime ha adịghị mma oriri. Nke a mere na onye amaghị anya ero a naghị akpata ero n'ọhịa. E nwere ero a na-akpọ ata-achakaanya. Ọ na-atọ ụtọ, mana ọ na-esi ike n'ọtita. Ofe ụfọdụ adikabeghịzị Ofe ụgbọgụrụ Ofe ụkpọ Ofe enwegii nnu Ofe ụtụrụkpa Ofe ogiri ohi. Ihe nkiri Akụkọ ga-amasị gị Di na nwunye irikọ nri: Gịnị ga-eme nwoke Igbo ajụ nri? Ịhapụ iri nri ụtụtụ o nwereike igbu gị n'oge erughị eru? Naanị ụgwọ otu ọnwa ka Naịjirịa ji Gernot Rohr - NFF
[ "Naijiria", "Nri", "Nchekwa nrị", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50072663
'Tanka nsi bụ ihe menyụrụ ọkụ n'Onitsha'
Ọkụ Ọnitsha ataala isi nne na nwa ya. Ọkụ a si 'Upper Iweka' gbaruo ochanja n'Onịcha, ndị uweojii si na ha amatabeghi mmadụ ole nwụrụ n'ihe mberede a.
2019-10-16T15:09:51Z
Onitsha tanker explosion: Tanka nsi bụ ihe e jiri menyụọ ọkụ n'Onitsha
Ebe ọkụ ka na-agba Kirie ihe onyoonyo ebe ndị mmadụ ji mmiri 'pure water' na-ebuso ọkụ a agha: Tanka bu mmanụ ụgbọala awụfuola ma nwuru ọkụ nke bidoro gbawa kamgbe elekere iri na abụo nke oke ụtutụ taa n'Ọnisha. Ndị uweojii kwuru na ha amabeghi mmadụ ole ọkụ a rere, mana ha ebusoola ọkụ a ọgụ n'iji menyụọ ya mana ọ ka pere mpe fọrọ. Ọkụ a bidoro na 'Upper Iweka' were ruo Ọchanja nke di n'Ọnịcha. Ọ pụtara na ndị na-anya tanka mmanụ karịrị gọọmentị? Ị hụla ihe gọọmentị Lagos chọrọ ka tanka na gwongworo na-emezi ugbua? Ọkụ a gbara rutere ahia Ọchanja na 'Relief' nke dị na Ọnịcha. Ihe ndị Uweojii kwuru Ndị uweojii ekwuola na ọkụ a ataala isi nne na nwa ya obere. Ha sị na o bidoro n'ihe dịka otu nkeji tupu elekere otu akụọ (12:59) nke ehihie ka Tanka a dara were kwafuo mmanu ụgbo ala n'ime ọwa mmiri. Ihe onyeisiala Buhari kwuru: Onyeisiala Buhari gbarụrụ ihu n'ọnwa otu nwaanyị na nwa ya n'ọkụ ọgbụgba a. N'okwu ya "O metụrụ m n'obi mgbe m hụrụ ahụ nwaanyị na nwa dịka ọkụ repịara ha n'ihe mberede a". Ọ gakwara n'ihu kele ndị ọzọ nke nwe ụlọọahịa, ụlọ obibi, ụgbọala ọkụ a metụtara. Onyeisiala Buhari nyere iwu ka minista maka ime njem nakwa ụlọọrụ na-ahụ maka ime njem n'udo ka ha gbaa mbọ lebanya n'okwu banyere nchekwa njem okporoụzọ. Ihe Gọvano Willie Obiano gwara ndị Anambra 1) Obi dị ya nwute maka ihe mere ọkachasi nne na nwa ọkụ a gburu. 2) ndi ọru ha bu imenyụ okui bụ ' Anambra state Fire service' biara n'ọge, mana ndị iwe na ewe ekweghi ka ụfodu n'ime ha gafee. 3) O kwuru ka ndị niile ọkụ a gbara ihe kụ bia na ụlo gọọmenti n'ụbochị Mọnde nke iri abụo na otu ọnwa Ọktoba. 4) A ga-ehibe nzụko ga-achopụta ihe kpatara oku a n'ezie 5) Gọvanọ Obiano si na ezinulo ya niile na ekpere ndi nwụru ekpere ma kwuo kwa na ha ga-enyere ezinụlo ha aka were lie ha. N'igwe soshial medịa, ndị mmadụ na-ekwu na ma ụlọahịa ndị mmadụ ma ụgbo ma ụlọ na-erefu n'ọkụ a dịka @Josahyah siri gosi: Mana mgbe @Maxie_IsAwesome denyere n'ozi ya, ọ kpọkụrụ ndị mmadụ ka ha na-ekpere ndị dị nso ka ha gbata ọsọ enyemaka: @Nonny_marshal dere na ọkụ a ferela n'Ọchanja na Fegge:
[ "Naijiria", "Anambra Steeti", "Ecowas", "West Africa", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50072665
BBC 100 Women 2019: Kedu ndị aha ha so?
BBC eweputala aha ụmụnwaanyị 100 ndi a ma ama kacha akwalite ma na ewepụta ihe ọhurụ n'afo 2019. N'afọ a ka ụmụnwanyi 100 na ajụ: Kedu ka echi ga-adị ma ụmụnwaanyị bụrụ ndị ndu?
2019-10-16T20:11:38Z
BBC 100 Women 2019: Kedu ndị aha ha so?
Images of many of the BBC's 100 Women 2019 BBC eweputala aha ụmụnwaanyị 100 ndị a ma ama kacha akwalite ma na ewepụta ihe ọhụrụ n'ụwa niile gburugburu n'afọ 2019. N'afọ a ka ụmụnwaanyị 100 na ajụ: Kedu ka echi ga-adị ma ụmụnwaanyị bụrụ ndị ndu? Aha ndị a gụnyere onye na-ese ụlọ chọrọ irụgharị mba Syria, Onye na edu ndị na-arụ ụgbọelu ga aga ụwa Mars na Nasa, ọtụtụ ụmụnwaanyị ndi edeputara aha ha bụ ndị ọkamụta n'ọrụ ha, Ha ga-akọwara anyi etu ha chere n'ụwa ga adi n'afọ 2030. Ndị ọzọ gụnyere onye ndọrọndọrọ ọchichị 'ana amaghi' na emegide ndi otu nzuzo 'Mafia', ma kwa ndị na-agba bọọlụ na alụso ikpa oke maka na ha bụ ụmụnwaanyị, ndi a niile ji ndu ha egosi ndị ọzọ ụzọ . Ụmụnwaanyị bụ ndị Afrịka aha ha so bụ 9) Rida Al Tubuly - Onye na-achọ udo, Libya Dịka ọgbaaghara di na mba Libya, otu nwaanyị bụ Rida Al Tubuly na-achọ ka enye ụmụnwaanyị ohere ka ha soro n'ọchịchị ya bụ obodo ka ha nwee ike dozie obodo Libya. Otu ya bụ 'Together We Build It' na-achọ ụzọ i si dozie ma kwụsi ọgbaaghara na mba Libya. N'afọ gara aga ka ọ gwara ndị na-ahụ maka ikike dịịri onye nke ndị UN na ha anaghị etinye ụmunwaanyị na nzụkọ gbasara ọdinihu Libya. Tubuly bụ onye nkụzi na mahadum ma nwee kwa ntụrụụgo nke agụmakwụkwo ' International Human Rights Law'. 16) Judith Bakirya - Onye ọrụ ugbo, Uganda Judith Bakirya bụ onye eji ọrụ ugbo zụọ bụ onye mbu n'ime ndị ebiri ya nwetara ntụrụugo ị ga-akwụkwọ sekọndịrị na-efu. Mba Uganda nyere ya ntụrụụgo nke ọrụ ugbo. O ji ohere a ekwusi okwu ike maka inye ụmụnwaanyị ikike ruru ha nke gụnyere inwe ala, ịgụ akwụkwọ na ikwusi imegbu ụmụnwaanyị n'ezinụlọ. 27) Salwa Eid Naser - Ọgba ọsọ, Nigeria/Bahrain Salwa Eid Naser meriri 400 metres na Doha n'afọ a. A mụru ya n'Anambra steeti kama ọ gara mba Bahrain dịka ọ na-achọ ebe ọ ga-enweta ohere ito dịka onye na-agba ọsọ. 28) Rana el Kaliouby- Onye na-arụ kọmpụta na-eme ka mmadu, Egypt Rana el Kaliouby so na ndị mbụ bidoro rụwa igwe kọmputa na-eme ka mmadu n'Egypt. Ihe na-amasi ya bụ ihụ na ụmụnwaanyị nwetere ohere ụmụnwoke na-enweta na Teknụzụ. 30) Lucinda Evans - Onye na azọchitere ụmụnwaanyị oke ruru ha, South Africa. Evans na-agba mbo ihu na ụmụnwaanyi South Africa nwetere ikike ruru ha na-agbanyeghi na mwakpo na ogbugbu ụmụnwaanyi na-ari elu na South Africa 42) Asmaa James- Onye Ntaakụkọ/Onye na-akwalite ọdịmma, Sierra Leone James na ekwuchitere ndị na enweghi etu ọha ha na Sierra Leone. Ọ mere ka ụmụnwaanyị mba ahụ na-eyi uwe ojii iji na ụbọchị Tuzde nke ikpeazụ n'ọnwa niile dịka ụzọ ha si ekwu na ha achọghizi mwakpo ụmụaka ụmụnwaanyị. Ihe kpaliri mụọ ya bụ mwakpo awakporo nwatakịrị dị afọ ise. 45) Gada Kadoda- Injinịa, Sudan Dr Gada Kadoda na-ekuziri ụmunwaanyi bi na ime obodo etu ha ga esi were anwu adobata ọkụ latrik n'obodo ha. 47) Ahlam Khudr - Onyeisi ndị na-eme ngagharịiwe, Sudan Onye bara onwe ya ' Nne ndị Sụdan niile nwụrụ maka ihe ha kwenyere', Egburu nwa Ahlam nwoke gbara afọ iri na asaa n'afọ 2013 mgbe a na-eme ngagharịiwe udo. Kamgbe ahụ ka Ahlam wepụtara ndụ ya ịchọ ikpe ziri ezi maka ọnwụ nwa ya na kwa ịkwado ikike ruru ndị niile nwụrụ maọbụ ndị 'furu efu' na mba Sụdan. 55) Julie Makani - Dọkinta na onye sayencị, Tanzania Julie etinyela afo iri na abụo iji chọpụta etu a ga esi agwọ ọrịa 'Sickel cell' ma na arụkwa ọrụ iji hụ na ndi mmadụ chọpụtara maka ọrịa ahụ. 61) Raja Meziane - Ọgụụ egwu, Algeria Raja Meziane na eji egwu egosipụta mpu na nrụrụaka di n'ọchịchị mba ya. 96) Purity Wako - Onye ọzụzu maka ndụ , Uganda Purity na-gba mbọ ihu na ụmụnwaanyị nwere ikike ruru ha n'ezinulo. 63) Benedicte Mundele - Onye na-azụ ahia nrị, Democratic Republic of Congo O mepụtara ọtụtụ nrị sitere n'ime ji bekee na 'Passion Fruit' nke ndị ogbenye ga azụtanwụ. 69) Farida Osman - Onye na-egwu mmiri, Egypt Ọ na ekwusi okwu ike ka ụmụakwụkwọ mahadụm tinye ụchụ n'ịgwu mmiri. Osmann ritere ọla nchara n'igwu mmiri n'afọ a. 81) Nanjira Sambuli - Onye na-ahu maka ụmụnwaanyị i so na Teknụzụ Dijital, Kenya Sambuli na-agba mbo ihụta na ụmụnwaanyị niile na mba Kenya nwere ike inweta ịntaneti. 83) Hayfa Sdiri - Entrepreneur, Tunisia Mgbe ọ dị afo iri na isii ka o wepụtara ụlooru na abụghi maka ikpa ego bụ 'Entr@crush' ebe ndị ntoroọbia ga enwe ike inweta nkwado ma gụọ akwụkwọ n'ihe dị ka 'management' na 'accounting'. O sokwara ndị UN rụọ ọrụ n'ihe gbasara oghata ọha na-ebe nwoke na nwaanyị. 90) Kalista Sy - Onye na-ede ma na eme ihe ejiji, Senegal Ihe ejiji ọmepụtara nke akpọrọ 'Mistress of a married man' wuru ewu n'obodo ha. Ihe ejiji a gosiri ụmụnwanyị na-eme ọfụma ma gosikwa nsogbu ndị lụru ọtụtu nwaanyị na ọrịa ụbụrụ . Ụmụnwaanyị ndị ọzọ so na abụghị ndị Afrịka 1) Precious Adams- Ote Egwu, US 2) Parveena Ahanger - Ikike ruru onye, Indian-administered Kashmir 3) Piera Aiello - Ndorondoro ochichị, Italy 4) Jasmin Akter - onye egwuregwu Cricket, UK/Bangladesh 5) Manal AlDowayan - Nka, Saudi Arabia 6) Kimia Alizadeh - Taekwondo , Iran 7) Marwa Al-Sabouni- Architect, Syria 8) Alanoud Alsharekh - Ikike ruru ụmunwanyị, Kuwai 10) Tabata Amaral - Ndorondoro ochichị, Brazil 11) Yalitza Aparicio - Onye ihe ejiji , Mexico 12) Dayna Ash - Omenala, Lebanon 13) Dina Asher-Smith - Atọgbaọsọ, UK 14) MiMi Aung - 'Project manager' na Nasa', US 15) Nisha Ayub - 'Transgender rights activist', Malaysia 17) Ayah Bdeir - Onye azụmahia, Lebanon 18) Dhammananda Bhikkhuni - 'Monk', Thailand 19) Mabel Bianco - Dọkinta, Argentina 20) Raya Bidshahri - Nkụzi, Iran 21) Katie Bouman - Sayence, US 22)Sinead Burke - Ikike diiri ndi meruru ahụ, Ireland 23) Lisa Campo-Engelstein - 'Bioethicist', US 24) Scarlett Curtis - Ode akwukwo, UK 25) Ella Daish - 'Environmentalist', UK 26) Sharan Dhaliwal - Ode akwụkwọ, UK 29) Maria Fernanda Espinosa -OnyeisiUN General Assembly, Ecuador 31) Sister Gerard Fernandez- Roman Catholic nun, Singapore 32) Bethany Firth - 'Paralympic swimmer', UK 33) Owl Fisher - Onye ntaakụkọ, Iceland 34) Shelly-Ann Fraser-Pryce - Ọgba ọso, Jamaica 35) Zarifa Ghafari - 'Mayor', Afghanistan 36) Jalila Haider - Okaikpe, Pakistan 37) Tayla Harris - Australian rules footballer and boxer, Australia 38) Hollie - Trafficking survivor, US 39) Huang Wensi- Oti okpo, China 40) Luchita Hurtado - Nka, Venezuela 41) Yumi Ishikawa - Onye bidoro #kutoo movement, Japan 43) Aranya Johar - 'Poet', India 44) Katrina Johnston-Zimmerman - 'Anthropologist', US 46) Amy Karle - 'Bioartist', US 48) Fiona Kolbinger - Onya inyinya igwe, Germany 50) Aïssata Lam - 'Microfinance expert', Mauritania 51) Soo JungLee - 'Forensic psychologist', South Korea 52) Fei-Fei Li - Igwe na-eme ka mmadụ, US 53) Erika Lust- Ejiji, Sweden 54) Lauren Mahon - Onye meriri ọrịa kansa, UK 56) Lisa Mandemaker - 'Speculative designer', Netherlands 57) Jamie Margolin - 'Climate change activist', US 58) Francia Márquez - 'Environmentalist', Colombia 59) Gina Martin - 'Campaigner', UK 60) Sarah Martins Da Silva - 'Consultant gynaecologist/obstetrician', UK 62) Susmita Mohanty - 'Space entrepreneur', India 64) Subhalakshmi Nandi - 'Ikike ruru ụmụnwaanyị, India 65) Trang Nguyen - 'Conservationist', Vietnam 66) Van Thi Nguyen - Onye nwe ulooru na 'disability rights advocate', Vietnam 67) Natasha Noel- Yoga , India 68) Alexandria Ocasio-Cortez - Nwaanyi omeiwu, US 70) Ashcharya Peiris - 'Designer', Sri Lanka 71) Danit Peleg- 'Designer', Israel 72)Autumn Peltier - Maka miri dị ọcha, Canada 73) Swietenia Puspa Lestari - 'Diver/environmentalist', Indonesia 74)Megan Rapinoe -Onye egwu bọolụ, US 75)Onjali Rauf - Ode akwụkwo, UK 76) Charlene Ren - Mmrir di ọcha, China 77) Maria Ressa- Ntaakụko, Philippines 78) Djamila Ribeiro - Ode akwụkwo, Brazil 79) Jawahir Roble - Onye na-egbu eguregwu bọọlụ, UK/Somalia 80) Najat Saliba - Okammuta Kemistirị, Lebanon 81) Nanjira Sambuli - 'Digital equality expert', Kenya 82) Zehra Sayers - Sayencs, Turkey 84) Noor Shaker - Sayensi nke Komputa, Syria 85) Bonita Sharma - Onye mmeputa, Nepal 86) Vandana Shiva - 'Environmentalist', India 87) Pragati Singh - Dọkinta, India 88) Lyubov Sobol - Okaikpe, Russia 89) Samah Subay - okaikpe, Yemen 91) Bella Thorne - Onye Ejiji, US 92) Veronique Thouvenot - Dokinta, Chile 93) Greta Thunberg - 'Climate change activist', Sweden 94) Paola Villarreal - 'Computer programmer', Mexico 95) Ida Vitale - 'Poet', Uruguay 97) Marilyn Waring - 'Economist and environmentalist', New Zealand 98) Amy Webb - 'Futurist', US 99) Sara Wesslin - Nkaakụko, Finland 100) Gina Zurlo - Ọmụmụ ofufe, US Photo credits: Photo copyrights: Karolina Kuras, Hans Jørgen Brun, Nicola Virzì, Sage Sohier, Christian Petersen/Getty Images, Mooreyameen Mohamad, Amelia Allen, Getty Images/Maja Hitij, UN, British Swimming, Hauser & Wirth, Oresti, Tsonopoulos, Kawori Inbe, Amal Adam, Matt Kay, Constanza Lavagna, Paula Mitre, Theo Kruse, Venura Chandramalitha, Luis Crispino/Claudia Magazine, Anders Hellberg, Graciela Buffanti, Wakophotography, IBF China, Germana Costanza Lavagna, Neal Hardie, Sharon Kilgannon, Hanna Sotelo, Sumit Kumar Singh, Päivi Mäkelä, Pimienta Films, Siddharth Das, Venura Chandramalitha, Linda Roy by Irevaphotography Gịni ka ụmunwaanyị 100 pụtara? BBC ụmụnwaanyị 100 ndị a ma ama kacha akwalite ma na ewepụta ihe ọhụrụ n'afo obụla ma kọọ akụko ha. N'afọ a ka ụmụnwanyi 100 na ajụ: Kedu ka echi ga-adị ma ụmụnwaanyị bụrụ ndị ndu? Soro anyi na Facebook, Instagram na Twitter ma cheta were #100Women.
[ "Europe", "Naijiria", "Ahụike echiche", "Amerika", "Ikike ụmụnwanyị", "West Africa", "Asia", "South Africa", "North America", "Ahụike", "Ọwụwa anyanwụ Afịrịka", "Afịrịka", "Latin America", "Ụmụnyanyị", "Ahụike ụmụnwanyị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50078876
Amapụtala m ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari
Onyeisiala Buhari sị na ọmapụtala ego dị ijeri naịra iri maka ịrụzi ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.
2019-10-17T06:10:02Z
Enugu Airport Closure: Amapụtala m ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari
Akụkọ dị mkpa Amapụtala ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari Onyeisiala Muhammadu ekwuola na ọmapụtala ego dị ijeri naịra iri maka ịrụzi ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu. O kwuru na o mere nke na-agbanyeghi ụkọ ego dị n'iji arụpụtala ihe dị iche iche chere gọọmentị n'ihu. Lee ọnọdụ ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu steeti Malitenu ọrụ n'ọdọugbelu Enugu nke taa nke echi - Ndịomeiwu Onyeisiala Buhari sị na dịka ọ bụ ọrụ dịrị gọọmentị ya ịrụ akụrụngwa dị n'obodo na ọ bụ nke a. O kwuru na minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekweela ya ngwa na a ga-arụcha ọdọụgbọelua n'oge na-adịghị anya. Cheta na o ruola ihe dịka izuụka itoolu gọọmentị mechiri ọdọụgbọelu ma kwuo na a chọrọ ịrụzi ya. A ga-ebelata ego ndị ụlọọrụ gọọmentị ji eme njem Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ka ebelata ego ndị ọrụ gọomentị gbalitere n'ọkwa. Site ụgbụa gawa n'ihu, 1) Nanị ụbọchị onye ọrụ a kwesịri i nọ maka nzụklo ọbụla ka gọọmenti ga akwụ ụgwọ ya. Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ gbasara budget 2020 Buharị ga-ebupute akwụkwọ etu gọọmenti ga-esi mefu ego n'afọ na-abịanụ 2) Onye ọbụla na-aga nkem ga egosi akwụkwo na-egosi ihe kpatara o ji eme njem. 3) Ọ bụ nanị njem gbasara gọomenti ka a ga agwụ ụgwọ ya. 4) Mmadụ anọ nani ga eso ndị minista eme njem nke ga agunye 'Director', 'Schedule Officer' na onye enyemaka Minista. Ndị minista ka n'ọkwa bụ mmadu atọ. 5) Onyeisiala kwuru na ọ bụ nani ụgboro asatọ ka gọomentị ga-akwụ ụgwọ njem n'afo. kama,ndị minista, 'Permanent Secretary', onyeisioche ndị 'Extra-Minsterial Departments', 'Chief executive officers' na ndị 'Director'. Ndịagha Naịjirịa esila n'ịgba Egwueke banye Atilogwọ Udo Ndịagha Naịjirịa sị na emume 'EGWUEKE' ha na-eme n'ọwụwanywnụ Naịjirịa ga na-aza zi 'ATỊLỌGWEỤ UDO'. Ozi a dị n'akwụkwọ ozi si n'akara Twitter ha bụ nke onye nghazi mgbasaozi ha bụ Aminu Iliyasu tinyere aka na ya. "Ụjọ ka ji ụmụaka obodo a" - Ezinaụlọ na agbatobi Nnamdi Kanu 'Anya ndị agha adịghị n'ọchịchị' Emume a dịka ha si kwuo bụ nke ha na-eji azụ ndịagha n'ụzọ dị iche iche malitere n'afọ 2016. Ndịagha sị ha na-ejikwa emume a ememina mpụ ndị dịka ohi, ntọrị mmadụ, agha ndị otu nzuzo, esemokwu dị n'etiti obodo nakwa ndị ọzọ. Ha kwukwara na mgbanwe aha emume apụtaghị na usoro e ji eme ya agbanwela, na usoro niile ha ji eme ya ka kwụ etu ọ dị na mmalite. Cheta na ọ bụ n'oge emume 'EGWUEKE' nke afọ 2017 ka ndịagha wakporo ụlọ onyendu Ipob bụ Nnamdị Kanu dị n'Afara Ukwu Ibeku Umuahia nke Abia Steeti. Boris Johnson sị na Briten na UK enweela nkwekọrịta Otu 'European Union' na mba Briten enweela nkwekọrịta maka etu Briten ga-esi hapu EU dịka Praịm Mịnịsta Briten bụ Boris Johnson sị kwuo. Ha nwere mkparịtaụka a n'Obodo Brussels nke dị na mba Belgium. Johnson kwuru na "anyị enwetela ezigbo nkwekọrịta ga-enye anyị nnwereonwe". Ọ teela ndị isi mba abụọ a ji enwe mkparịtaụka maka ọdịmma onwe ha ma ọ bụru na Briten hapụ EU, mana nkwekọrịta a ha nwere ka ga-aga n'ihu ndị omeiwu mba Briten nakwa nke ndị EU iji binye ya aka. Mana ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị a kpọrọ 'Democratic Unionist Party' (DUP) ka na-ekwusi ike na ha akwadoghi nkwekọrịta a. Ndị pati a bụ nke ndị Northern Irish ekwubụọla na ha agaghị atụkwasi obi n'okwu Johnson. Onyeisi ndị anọghị n'ọchịchị bụ Jeremy Corbyn boro aka n'isi tie mkpu sị na mkpebi a Johnson na aṅụrịrị kakwa njọ karịa nke Theresa May nwetere. Corbyn kpọkuru ndị otu ya ka ha ghara ịge Johnson nti n'ihi na okwu ya bụ okwu onye awụrụaka. N'aka ọzọ onyeisi European Commission bụ Jean-Claude Juncker sị na ya bụ mkpebi dị mma n'ụzọ ga-abara mba abụọ ahụ uru. Aisha Buhari na ndị enyemaka ọhụrụ Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya Ị nụrụ na nwunye onyeisiala bụ Aisha Buharị enweela ndị enyemaka mmadụ isii ọhụrụ. A nụrụ na ndị a gụnyere Mairo Almakura, Muhammed Albishir na Wole Aboderin. Ndị ọzọ bụ Aiyu Abdullahi, Zainab Kazeem na Funke Adesiyan. Aisha ji ohere a arịọ mgbaghara maka ya bụ ihe onyonyo pụtara na sochịal midia ebe ọ na-abamba. Trump ekweghị ojiji Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Akọgbuola onyeisiala Trump n'ọnụ maka mkpọpụ ọ kpọpụrụ ndịagha Amerịka na Syria. Trump n'onwe ya achọkwaranụ ịma, ebe ọ na-ekwu na Amerịka abụghị ndị uweojii mbaụwa. A na-eche na ọ bụ maka ọpụpụ a Amerika pụrụ mere ndị Turkey ji malite ibuso ndị Kurd agha ọzọ. Egwu a chaala Pogba Paul Pogba a gbaala ise n'ime asọmpi asato Manchester United gbara n'ọgbọ a Kedu ka ị sị hụ ọnọdọ Manchester United n'Asọmpi ha na Liverpool na-aga ịgba? Onwebeghi onye ma ebe ha bụ asụrụ asụ dewere ọdụ ebe a sị na Paul Pogba agaghị esokwa gba ya bụ bọọlụ. Anyị nụrụ na Pogba merụrụ ahụ dịka ojisiaghọ mgbo ha bụ de Gea. Gee akụkọ ndị n'otu nkeji Lee ihe nkiri anyị taa Akụkọ ga-amasị gị taa Ndị uweojii Bulgarịa anwụchiela mmadụ isii na-akwado ịkpa oke agbụrụ Ọ bụ gịnị na-ese okwu n'Aso Rock? BBC 100 Women 2019: Kedu ndị aha ha so?
[ "Naijiria", "Abia Steeti", "Enugu Steeti", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Anambra Steeti", "Ebonyi Steeti", "Ndịagha", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50078882
'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border''
Ndị Igbo na-azụ ahịa akọwala etu mmechi okeala si metụta ha nakwa azụmaahịa ha.
2019-10-18T07:12:35Z
Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border''
Ọtụtụ ụmụ Igbo na-azụ ma na-ere ahịa gbarụọla ihe na mmechi okeala Naịjirịa na mba ndị nke gọọmentị mechiri. N'ime nyocha BBC Igbo mere iji mata etu mmechi okeala a si metụta ha, ha kwuru na onweghi ahia ha na-azụta. Na nke a mere ha ji erezi ngwaahịa ha oke ọnụ, nke ndị na-azụ ha ahịa na-eme mkpesa banyere ya. Mana otu onye sị na nke a emetutaghị ya maka na ọ na-eji ụgbọelu ebubata ngwaahịa ya si na mba Chaịna. Kirie ihe ha kwuru n'uju. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
[ "Ịji ego achụ ego", "Azụmahịa nke kọmpụta", "Naijiria", "Uchu n'ọrụ", "Cameroon", "Ndọrọndọrọ ọchịchị", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "Bini", "Niger" ]
https://www.bbc.com/igbo/50094909
'Ọrụ ga-amalite n'ọdọụgbọelụ Akanụ Ibịam n'abalị iri na-abịa' - Onyeisi na FAAN
Onyeisi na FAAN agbaala ama na ọrụ ga-amalite n'ọdọugboelu Enugu n'ihe dịka abali iri na-abịanụ.
2019-10-18T10:28:55Z
Enugu Airport: 'Ọrụ ga-amalite n'ọdọụgbọelụ Akanu Ibiam mgbe adịghị anya' - Onyeisi na FAAN
Akanu-Ibiam Airport Enugwu Otu n'ime ndị isi n'ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ụgbụọelụ bụ Federal Airports Authority of Nigeria nke akpọrọ FAAN na aha ịchafụ agbarala BBC ama ndị mmụọ. Nwaamadị a gbaara anyị ama a na-achọghị ka akpọ aha ya sị na ugbua onyeisiala nyegoro ikike ka ewepụta ijieri naịra iri tinye na ya bụ ọrụ, na oge eruola mgbe ha ga-amalite ya bụ ọrụ n'ikem n'ikem. Amapụtala m ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari Ndịọrụ ụgbọelu n'Enugu Airport na-ebe kpaa maka mmechi e mechiri ya Ọ bụ eziokwu na ọrụ amalitela n'ọdọụgbọelu dị n'Enugwu? BBC jụrụ ya ma ya bụ ego onyeisiala Muhammadu Buhari mapụtara ọ ga-ezu ya bụ ọrụ, ọ sara na ọ bụ ego ha tinyere ka onyeisiala nyere ha. Ọ sịkwa na ihe bụ ọkpụrụkpụ ọrụ dị na ya bụ akwụkwọ ha depụtara maka ya bụ ọrụ bụ ihe gbasara irụgharị okporoụzọ ụgbọelụ Akanu Ibiam ya na ọrụ ndị ọzọ na-erijughị afọ. A ga-emechi ọdụ ụgbọelu Enugwu n'Ọgọst 24 Buhari kwenyere n'atụmatụ niile ndị Ọwụwa Anyanwụ wepụtara - Gọvanọ Umahi O kwetere na ya bụ ego gọọmenti tinyere aka na ya ga-ezu ya bụ ọrụ. Ya bụ nwaamadị kwuru na obi ụtọ ya bụ na mmiri ozizo akwụsịwala nke bụ na ha nwere ike ịmalite ya bụ ọrụ tupu abali iri agachaa. Ọnwere okwukwe na ha ka ga-arụcha ya bụ ọrụ tupu Ekeresimesi etinye ukwu. Akụkọ ga-amasị gị 'Tanka nsi bụ ihe menyụrụ ọkụ n'Onitsha' Ụfọdụ nri ndị Igbo anaghị erikawazị Naanị ụgwọ otu ọnwa ka Naịjirịa ji Gernot Rohr - NFF Lee ihe nkiri ihe Coscharis kwuru maka ịmechi bọda Naịjrịa
[ "Naijiria", "Enugu Steeti", "Njem ụgbọelu", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50094913
Uche ndị ntorobịa gbasara ọnụ isi
Ụmụ ntorobia na-ekwu ihe ha na-eme ma ọ bụrụ na enyi ha nwere ọnụ isi.
2019-10-18T11:39:34Z
Mouth Odour: Uche ndị ntorobịa gbasara ọnụ isi
Igbo na-atụ ilu na-asị na onye nọ mmadụ nso na-anụ isi eze ya. Mana kedụkwanụ ka ị nwere ike isi gwa enyi gi na ọnụ ya na-esi isi ka ọ ghara ịdị ka ị na-akparị ya akparị? Lee ihe ndị ntorobịa anyị na ha nwere mkparịtaụka gwara anyị. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
[]
https://www.bbc.com/igbo/50078884
Jurgen Klopp na-agbara ndị Man Utd egbe ọnụ
Ndị otu Manchester United na Liverpool ga-ama onye ga-aza "a kwaa a kwụrụ" mgbe ha zutere n'ụbọchị 20 nke Ọktoba 2019.
2019-10-18T17:37:10Z
Man United vs Liverpool: Ndị Man Utd a ga-atụpụrụ Jurgen Klopp ọnụ?
Jurgen Klopp Liverpool ji pọintị asatọ aga Manchester City bụ ndị nọ n'ogogo abụọ na tebulu Premier League Ndị Man Utd unu a ga-eyiri ọbante jee ọgụ? Aka na-achịkọta Liverpool bụ Jurgen Klopp na-agba egbe ọnụ maka ihe ọ na-eche na ndị otu ya ga-eme Man Utd n'ụbọchị ụka. Klopp kwuru na ya ma na ndị Man Utd na-ekwu okwu igbanwe ọnọdụ ha, mana ọ sị ha cheretukwuo otu izu (ka ha kụzichaara ha ihe) tupu ha amalite ya bụ mgbanwe. West Ham etiela Man United ka ịgba udubọnch Newcastle echiela Man United 'E cheta ebewe nke mbụ n'Ịngland' O kwukwara na "echeghị m na e nwere ọtụtụ otu egwuregwu ga-achọ izute anyị ka ọ dị ugbua". Ma sị " Man Utd nọ n'ọnọdụ na-amasịghị ha, ha chọkwaranụ ịgbanwe ya. Anyị ga-agba mbọ ịhụ na mgbanwe ahụ ha na-achọ ga-amalite n'izu na-abịa nụ (mgbe anyị zutechara). Ọ gwụchaa!" A chụọla osote gọvanọ Kogi steeti ụkwụ eru ala Simon Achuba ga-anọ n'ịta ikikere eze ugbua dịka ndị ụlọomeiwu steeti ya gbakọrọ aka chụtuo ya n'oche. Ha boro ya ebubo agwa ọjọọ nakwa ihe ndị ọzọ. Cheta na Achuba na Gọvanọ steeti ya na-ese okwu kemgbe. Ebee ka nwoke a ga-esi bido ebido? Otu nwoke nọ eche ụwa ya ugbua ka ọkụ Ọchanja napụrụ ya ụlọahịa ya, nke gbara n'Ọmọba anapụ ya ụlọobibi ya nakwa ụgbọala ya. Ọkụ malitere ịgba n'Ọmọba ebe elekere atọ nke isi ụtụtụ ụbọchị 18 nke ọnwa Ọktoba 2019 N'agbanyeghị na mmadụ anwụghị na nke Ọmọba, ụzụ akwa na-atụ n'ihi na ụlọ na ụgbọala gbachara ọkụ. N'isi ụtụtụ, ndị bi n'Ọmọba Ọnịcha tetara ụra n'elekere atọ nke isi ụtụtụ dịka tanka bu mmanụ ụgbọala dara ma wụsasịa ihe o bụ n'ala. Ya bụ mmanụ ghọrọ ọkụ dị ka nke Ọchanja siri mee. Lee ihe ndị mmadụ gabigara n'ọkụ abụọ gbara n'Ọnịcha n'otu izu. Ogbunigwe alaala ndị mmadụ n'iyi n'Afganịstan Ogbunigwe a gbapụrụ na mpaghara Nangarhar Province Ihe karịrị mmadụ iri isii anwụọla ebe ọtụtụ merụrụ ahụ dịka ogbunigwe gbapụrụ n'ụlọekpere alakụba na mba Afganịstan taa. E nwebeghi ndị kwere na ọ bụ n'aka ha ka mwakpo ọjọọ a si. Ndị Shiite aghaala ike n'anwụ ọzọ Akụkọ si Abuja eru anyị ntị na-ekwu na ndị uweojii ji anwụrụ ose wee chụsasịa ndị otu Alakụba a kpọrọ Shiite mgba ha mere ngagharị iwe n'ehihie taa. Ndị otu Shiite ka na-akpọ oku ka a tọhapụ onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky nke gọọmentị etiti ji kamgbe afọ 2015. Ndị ọrụ na gọọmentị achabiela ehi ọdụ Ebe ndị ọrụ na gọọmenti na-etinyeaka n'akwụkwọ maka ụgwọọnwa ha N'ikpeazụ nghọtaghie dị n'etiti ndị ọrụ na gọọmentị etiti abịala na njedebe dịka ha nwere nkwekọrịta na ya. Dịka nzuko ha nọ na-aga n'ihu, mịnịsta steeti na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Festus Keyamo dere ya n'akara Twitter. Buhari mee ọsịsọ - NLC Minimum Wage: Etu ngagharịiwe ndị NLC si aga O dere "Site na mkparịta ụka gọọmentị na ndị ọrụ, ha ekwekọrịtala na nhazigharị puku naịra iri atọ ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ." Onyeisi otu a kpọrọ 'Trade Union Congress' bụ Quadri na odeakwụkwọ ya bụ Musa-Lawal Ozigi sị na nke a bụ eziokwu. Ha kelere gọọmentị na ndị ọrụ maka inwe ndidi na mkparịta ụka ha iji nwe nkwekọrịta. A ga-eji pasentị 23.2 bulie ego ndị nọ n'ogogo 7, pasentị 20 n'ogogo 8, pasentị 19 n'ogogo 9. Pasentị 16 maka ndị nọ n'ogogo 10 ruo 14, pasentị 14 na ndị n'ogogo 15 ruo 17. Nkwekọrịta ha na-abịa dịka ụbọchị otu narị na iri asatọ na abụọ gachara onyesiala Buhari tinyere aka na ya. Ụgbọala Tanka ọzọ agbaala ọkụ n'Ọmọba Ọnịcha Nwanna ọkụ a gbara n'Ọnicha ka bụkwa okwu akpụ n'ọnụ dịka ọtụtụ ihe onyonyo na-apụta na soshal midia. Dịka a na-ekwu nke a, ụgbọala Tanka ọzọ dara ma gbaa ọkụ n'okporoụzọ Ọmaba Phase 1 nke Ọnịcha na mgbede ụnyaahụ. 'Tanka nsi bụ ihe menyụrụ ọkụ n'Onitsha' Mana ndị uweojii site n'ọnụ onye na-ekwuru ha bụ Haruna Mohammed sị na o nweghi onye nwụrụ n'ọkụ a gbara. Mohammed kwuru na ha ebupụla ụgbọala Tanka a n'ụzọ ka ọ ghara igute kpachi kpachi okporoụzọ. Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ sị na ọ bụ mposi ka eji gbanyụọ ọkụ ebe ụfọdị ebe ndị ọrụ gbata gbat enweghị mmiri. Idemmiri emeela ndị mmadụ ịwa na Gana Ihe ruru mmadụ iri abụọ na asatọ anwụọla ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ihi oke mmiri ozuzu zoro ụbọchị asatọ na Gana Ihe karịrị ụlọ otu puku alariela n'iyi, mana n'agbanyeghi nke a egwu ka dị na ọnụọgụgụ ndị o metụtara ka ga-arị elu. Ed Woodward enweela iwe Ed Woodward bụ onye nọ n'aka ekpe Onyeisi otu egwu bọọlụ Manchester United bụ Ed Woodward sị na ọ bụ mkparị ị sị na ndị na-abụghị ndị boolu na-eme mkpebi n'ihe gbasara bọọlụ. Cheta na a sị na Woodward na-etinyekarị anya n'okwu ndị nchịkọta Man United. Gee akụkọ ndị n'otu nkeji Lee ihe nkriri Coscharis Akụkọ ga-amasị gị Otu nwoke adaala nwụọ na ọdọugbọelu dị na Legọs ka ọ nụrụ na nwunye ya nwuru Aisha Buhari abatala n'ike na ebube Gini ka ụbọchị 'No Bra Day' pụtara?
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Afịrịka", "Klaimet chanji" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50094915
'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra'
Lee ihe ị maghị maka Dick Tiger nwa Ihetu n'Amaigbo.
2019-10-19T12:23:11Z
'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra'
Ụmụnne Dick Tiger kwuru maka mbọ ọ gbara were pụta ihe dịka dike na dimkpa, nakwa ka o si nye aka n'agha Biafra. Ha kwuru na ya bụ nwaamadị tara ahụhụ nke ukwuu tupu ọ pụta dịka dike na dimkpa Igbo. O rere ololo mkpọ (karama) n'Aba tupu ọ malite ịkụ ịgbakwụ. Mgbe o merichara ọkpọ na Naịjria, ọ gara Briten ichere ndị ọcha aka mgba. Ọ dịghịrị ya mfe mgbe o ruru ebe ahụ. O mechara nwee obi ịdamba tupu Chi Igbo agbakwute ya. Mgbe ahụ ka ọ malitere ịkụpụ ndị ọcha mkpụru ọkwụru n'anya. Lee akụkọ a ka ị hụ ka o si gaa. Ndị mere akụkọ a: Chris Sanctus Okereke, Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo
[ "Akụkọ mgbe gboo", "Naijiria", "Egwuruegwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50107404
Ọkụ agbagbuola mmadụ atọ na Nnewi
Ka a ka na-ekwu nke a na-ekwu n'Anambra steeti, ọkụ egbukwaala mmadụ atọ ọzọ n'isi ụtụtụ.
2019-10-19T17:23:57Z
Anambra fire: Ọkụ agbagbuola mmadụ atọ na Nnewi
Ọkụ Ọchanja Ọkụ ka na-agba n'ime ụfọdụ ụlọahịa dị n'Ọchanja n'agbanyeghị na taa bụ ụbọchị anọ ọkụ a malitere Mmadụ atọ na-arụ n'otu ụlọ oriri na nkwari dị n'obodo Akwudo dị n'Otolo, Nnewi dị n'Anambara steeti anwụọla dịka ọkụ gbara ebe ahụ n'isi ụtụtụ taa. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed, gwara BBC Igbo na ndị uweojii nwụchiri onye nwe ebe ahụ maka ebubo na ọ na-agbachikarị ndị na-arụrụ ya ọrụ ma ha laba ụra n'ime ebe ahụ. Ọkụ ka na-agba n'Ọchanja Akụkọ si Ọnịcha eru anyị ntị na-akọwa na ọkụ tanka ahụ gbara n'ahịa Ọchanja ụbọchị atọ gara aga, ka na-enwu ruo ugbua. Ndị ihe ha lara n'iyi na ya bụ ọkụ ọgbụgba ka na-ekele Chukwu maka ndụ ha ma na-enwe olileanya. Ọnọdụ Brexit nọ ugbua Ndị omeiwu mba Briten 322 kwenyere ka e gbutukwuo oge tulee ihe, ebe mmadụ 306 chọrọ ya ọkụ ọkụ Enwebeghi ebe mba Briten ji azụ aga n'ihe gbasara okwu ọpụpụ ha bụ Brexit. Ndị ụlọomeiwu mba ha mere ntuliaka taa ebe ha kpebiri ka e chetukwuo obere tupu e mee ntuliaka ọzọ n'izu na-abịa, gbasara ọpụpụ ha nke Boris Johnson chọrọ. N'egwuregwu, Chelsea mechara gbara isi onwe ha n'aka ndị otu egwuregwu Newcastle dịka Marcos Alonso ji goolu dọrie poostu na nkeji iri asaa na atọ. Tottenham na onwe ha azanwughị aha nna ha ka ndị Watford ji otu goolu gwọọ ha ịba nke ga-eme ya ugboro abụọ na-eso ibe ya ha emeribeghi bọọlụ. 'Enweghị ntiwapụ ọrịa Monkeypox na Naijirịa' - NCDC Orịa MonkeyPox Dika ụfọdụ akwụkwọ akụkọ na-ekwu na ọrịa akpọrọ 'Monkey Pox' etiwapụla n'ụfọdụ steeti na Naijirịa, ngalaba na-ahụ maka ọrịa bụ Nigeria Centre for diseaase Control (NCDC) apụtala sị na 'E nweghị ọrịa monkey pox na steeti ndị a ma na Naijirịa niile'. Nigeria na Britain na-enyocha mmadụ abụọ bụbara ọrịa 'monkeypox' na Britain Lassa Fever: Ihe iri ị maghị maka ọrịa ọjọọ a Nke a sitere n'ozi Jeremiah Agenyi detara ndị BBC ebe ha kwuru na akụkọ na-ekwu na ọrịa Monkeypox etiwapụla na Legọs, Rivas na Akwa Ịbọm steeti bụ asi. Ha kwuru na kamgbe afọ 2017, na ha na enweta mgbesa maka ọrịa Monkeypox kwa izuụka n'otụtụ steeti dị na Naijiria. Ụfọdụ ndi gbatagbata nke NCDC gara nyocha na Akwa Ịbọm Steeti. NCDC kwuru na ha na-gba mbọ ichọpụta ọria a n'oge ma zigakwa ndị gbatagbata ha na steeti ọwụla achọpụtara ya bụ ọria. Ha kwụkwara na site na Jenụarị ruo onwa Sepụtemba 2019, na ha enwetela mkpesa maka ọrịa monkeypox na steeti itolu na Naijirịa. Mkpamkpa Iba Lasa ataala isi mmadụ anọ Ọrịa Iba Lasa awakpoola Naịjirịa ọzọ - NCDC Akwụkwo a kọwara na n'ime mkpesa iri asatọ na otu, ọ bu iri atọ na itolu bụ ọria monkeypox. Ha kwukwara na ọ bụ nanị otu onye nwuru site n'aka ọrịa n'ime mmadụ iri atọ na itolu. Ha rịọkwara ka ndị mmadụ gaa na websaịt ha ebe ha na-ebipụta akwụkwọ izuụka ọbụla maka ọrịa dị iche iche ka ndị mmadụ mara nke ekwe na-akụ. (Lekwa ya ebe a Monkey Pox) NCDC kwuru na na-agbanyeghị na enwere ọrịa a n'ụfọdụ steeti, kama ha amabeghi ọkwa maka na orubeghị nke ntiwapụl. 'Anyi gbụrụ otu onye ntọ' - Ndịagha Naịjirịa Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu na ndị ntọ agha n'ala Naịjiria Ndiagha Naijiria ndi nke 'Operation Thunder strike' egbuola otu onye ha siri bụ onye ntọrọ ma zọpụta kwa mmadụ atọ atọro n'okporo ụzọ Abuja-Kaduna. Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha bụ Ezindu Idimah kwuru na agbagburu onye ntọ a mgbe ha na ndịagha zutere ebe ụfọdụ ndị otu ya bu mgbọ egbe n'ahụ ha gbafuo. 'A ga-enyocha NDDC' - Muhammadu Buhari Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari enyela iwu ka enyocha ọrụ niile ngalaba Niger Delta Develpment Commission' rụrụ site n'afọ 2001 ruo 2019. Ihe mere ụlọikpe ji kwụsị ikpe Onnoghen Niger Delta Avenja: Anyị ga-amalite igosi iwe na ọnụma mgbe adịghị anya Nke a na-abia dịka ndị mmadu na akatọ etu ngalaba a si arụ ọrụ ebe Buhari si na ọrọ ngalaba a rụrụ egosaighi nkwado niile gọọmentị etiti nyere ha. N'Ofesi Ndị otu na-ere ọgwụike na ama ndi nchekwa aka na mba Mexico Onyeisiala Mexico bụ Andres Obrador ekwuola si ee na ha tọhapụrụ Ovidio Guzman bụ ọpara onyeisi ndị ọgwọike Sinolao Cartel eji El chapo mara. Obrador kwuru na ndị nchekwa nwụchirị ya ma hapu ya mgbe ndị otu ya lụsoro ha ọgụ ma wakpo ha. N'Egwuregwu Ndi otu egwu bọọlụ Super Eagles bi na Naijirịa Ndị otu egwu bọọlu super Eagles nke bi na Naijiria ga-ezute ndị nke Togo na Legos taa bụ 19th Novemba maka agba nke abụọ maka ntozu asọmpị Afrịcan Nations Championship nke a ga-agba na Cameroun. Cheta na ndi otu Togo ji goolu anọ asatara otu were merie ndị Super Eagles na be ha, kama ndị super Eagles na-agwa ndị Naijiria na ha ga emeri Togo . Akụkọ ga-amasị gị Jurgen Klopp na-agbara ndị Man Utd egbe ọnụ 'Ọrụ ga-amalite n'ọdọụgbọelụ Akanụ Ibịam n'abalị iri na-abịa' - Onyeisi na FAAN 'Tanka nsi bụ ihe menyụrụ ọkụ n'Onitsha' Ụfọdụ nri ndị Igbo anaghị erikawazị Ihe nkịrị ga-amasị gị
[ "Naijiria", "Bọọlụ", "Afịrịka", "Muhammadu Buhari" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50103752
Nwoke dị afọ 100 si ụlọmkpọrọ pụta anwụọla
Celestine Egbunuche bụ nwoke a maburu ikpe ọnwụ ma tọhapụ ọnwa ole gara aga nwụrụ na Pọrt Harcourt.
2019-10-20T05:57:31Z
Nigeria's oldest prisoner: Nwoke dị afọ 100 a maburu ikpe ọnwụ anwụọla
Ụlọmkpọrọ Naịjirịa Paul Egbunuche (nwa) na Celestine Egbunuche (Nna) Chisom nwa Celestine Egbunuche gwara BBC Igbo na nna ya kubiri ume n'abalị 18 nke ọnwa Ọktoba 2019, n'ụlọ ya na Pọtakọt. Chisom kwuru na tupu nna ya anwụọ, na ọ narala ya nri rie ọfụma (ọ naghị eribu nri ọfụma ka o si ụlọọgwụ lọta), mana o rughi otu awa o richara nri ahụ, ọ nwụọ. A tọghapụla nwoke dị afọ 100 a mara ikpe ọnwụ A tụọla Charles Okah nga mkpụrụ ọka Ụlọikpe atụọla Jolly Nyame nga maka mmerụaka Chisom kwuru na ọ na-eche na ọ bụ obi mgbawa mere nna ya ji nwụọ mgbe ọ nwụrụ, n'ihi na ọ jụgidere ese nwa ya nwoke bụ Paul a tụrụ ya na ya nga, ruo mgbe ọ nwụrụ. O kwuru na o legidere anya ịhụ Paul bụ onye a hapụrụ n'ụlọmkpọrọ ka a tọghapụrụ ya, mana ọ hụghị ya ruo n'oge ọnwụ ya. Chisom kọwara etu nna ya si na-ajụkwa ese nwunye ya, na-amaghị na ọ nwụrụ kemgbe afọ 2015 (maka ọnọdụ ya, o kweghị agwa ya na ọ nwụọla). Celestine jụkwara ese nwa ya nwoke nke abụọ, na-amaghị na Chisom na onwe ya ahụbeghi ya anya kemgbe afọ 2015. Chisom kwuru na ya magahị ma nwanne ya nwoke ahụ ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ. O kwuru na nna ya gbakechaghịkwa n'ọrịa a nọ na-agwọ ya ka o si n'ụlọmkpọrọ pụta, tinyekwuo afọ ole ọ dị (100), nke mere ka ọ ratụ obere ahụ ịnabata ọgwụgwọ ọfụma. Mgbe Celestine pụtara n'ụlọmkpọrọ n'ọnwa Juun 2019 Etu obi dị Chisom Chisom kwara arịrị maka etu nwụchi nna ya si tụgharịa ihe niile gbasara ndụ ha. O kwuru na anwụchiri Celestine n'afọ 2000, mgbe Chisom ka dị naanị afọ 15, nke mere ka ọ ghara ịgụchapụ akwụkwọ, wee kwụsị na nke Bekee kpọrọ JSS2. O kwukwara na ndị obodo ha n'Amachara dị n'Owerre-Akọkwa dị n'Imo steeti, gara kutuo ụlọ nna ya, nke bụ na ugbua, amabeghi ebe a ga-eli ozu Celestine. Ihe ị kwesịrị ịma maka Celestine Lee ihe ị kwesịrị ịma maka Celestine dịka nwa ya nwaanyị si kwuo A mụrụ ya n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọst 1918 Ọ bụbụ onye ojiegoachụego n'ugwu awụsa tupu nsogbu afọ 1966 achụlata ya Ọwụwa-anyanwụ. Ka ọ lọtara Ọwụwa-anyanwụ, o bi n'Ọnịcha ebe ọ malitere ịkwa/ịdụ akwa. O mechara laa n'ime obodo ya ebe ọ nọkwa na-adụ/akwa akwa. Ọ chọburu ichi fada ndị ụka Katọlik, nke mere o ji ghara ịlụ nwaanyị n'oge, mana o nweghizi isi n'ihi na ọ hụghị onye ga-akwado ya. Ọ mụrụ ụmụ anọ; Ada ya nwụrụ n'afọ 2005 ka ọ nọ na mkpọrọ, Paul nọ na mkpọrọ, nke nwoke nke ọzọ na-efu efu ebe naanị Chisom nọzị. Ọ nọrọ afọ 18 na ụma na mkpọrọ site n'afọ 2000 ruo Juun 2019 mgbe a tọhapụrụ ya. Ya na Paul nwa ya na-ekwu na aka ha dị ọcha n'ebubo ịtọrọ nakwa igbu mmadụ ka a na-azọ ala. Chisom na onwe ya na-arịọ gọọmentị ka ha gbaa mbọ hụ na a tọhapụrụ Paul nwanne ya makana ọ bụ naanị ya ka ọ fọzịrị ya. Ọ na-ekwukwa na ọ ga-amasị ya ka e lie nna ya n'obodo ha n'Akọkwa ebe ọ na-akọwa na ọ dịzị ka ebe ama ha shiri. Akụkọ ga-amasị gị: Ọkụ agbagbuola mmadụ atọ na Nnewi 'Ọrụ ga-amalite n'ọdọụgbọelụ Akanụ Ibịam n'abalị iri na-abịa' - Onyeisi na FAAN
[ "Naijiria", "Nga", "Ikpe", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-50114918
Lee teknụzụ ụmụ Igbo ji aka rụpụta
Teknụzụ ụmụ Igbo a rụpụtara ga-atụ gị n'anya.
2019-10-20T07:35:32Z
Technological Development: 'Igbaji ụkwụ emeghị m onye arịrịọ'
Ndị ntorobia Igbo nakwa ọtụtụ ụmụakwụkwọ mepụtara ihe ngosi teknụzụ dị iche iche iji wee mee emume ncheta nke 'World space day' 2019 mabụrụkwa emume ngosi 'Science Technology Engineering Mathematics akpọrọ STEM n'ichafu. Ụfọdụ mepụtara akụrụngwa ga-enyere aka ịkwụsị ọdachị mgbanwe ihu eligwe na-ebute, ebe ụfọdụ mepụtara "robotu" ga-emenwuru gị ihe ọbụla. Kirie ya n'uju ebe a.
[ "Science", "Tekinụzụ", "Ọmụmụ na mmụta", "Nkwarụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-50114920
Ọ bụ nwa nwoke! - Davido
David Adeleke ama dịka Davido ekelela nwaanyị ọchọrọ ịlụ bụ Chioma Rowland maka akatata nwa nwoke ọ mụrụ ya.
2019-10-20T08:56:55Z
Davido New baby: Nwaanyị ọchọrọ ịlụ amụọlara ya nwa 'agbaagba' nwa nwoke
Nwa nwoke Ure nwa ooooo! Davido etiwasala akụkọ ahụ ụmụ ụwa na-eche kamgbe. Cheta na oti egwu ama ama dịka Davido(David Adedeji Adeleke) depụtara ọsịsa o nyere onye na-ajụ ya maka egwu ọ ka na-etipute etipute, ndị mmadụ buru okwu ahụ gawa "ụlọakụ". Ọtụtụ ụmụ Naịjiria bidoro kelewe Davido makana ha chere na ọ bụ ọmụmụ nwa Chioma(onye ọ chọrọ ịlụ). Mana n'oge na-adịghị anya, Davido depụtara na David nke obere awụchiela ma tokwa nwunye ya bụ Chioma, na-ekwu na o siri ike. Davido ọ kwadola ịlụ Chioma? Davido egechiela Chioma! Lekwa ụfọdụ ekele ụmụ Naịjirịa bunyere Davido ka o depụchara na nwunye ya amụọla nwa. @_omoissy kwuru na ọ nọ na-eche akụkọ ọma kamgbe elekere iri na otu nke abalị fotere taa. @Amchizzy kelekwara ya. @Real_jaeflex na-ekpere ha ekpere ọma. @@PluckyPrecious kelere Davido maka etu o si kele nwunye ya. Akụkọ ndị ga-amasị gị Nwoke dị afọ 100 si ụlọmkpọrọ pụta anwụọla Ọgọ ukwu ndị Igbo nwere na mba
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50114868
Ụjọ atụla gị MTN agaghị ana gị ego USSD
Ka ọ fọrọ naanị otu ụbọchị tupu ndị ụlọọrụ na-ahụ maka iji ekwentị ezisaozi amalite ịna ego maka USSD, gọọmentị agwala ha chere.
2019-10-20T14:20:27Z
USSD meaning: Gọọmentị agwala MTN na ndị ọzọ kwụsị ịna ego maka USSD
Onye na-apị ekwentị Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Dkt Isa Ali Pantami enyela iwu ka MTN gbaa "brake" n'ịnapụ ndị mmadụ naịra anọ n'elu USSD. O kwuru na ọ maghị maka ozi a, nke mere na ọ gaghị aga n'ihu maọbụghị ma o doro ya anya bụ ihe ha na-eme. Nke a mere ka o zigara ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasaozi na Naịjirịa bụ 'Nigerian Communications Commission (NCC)' ozi, ka ha kwụsị atụmatụ a ruo mgbe ha tulechara ya. Nke a na-abịa dịka ndị MTN zipuru ndị mmadụ ozi sị na "bido ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba, anyị ga-amalite ịna naịra anọ kwa nkeji 20 ị nwara iji USSD gị". MTN zipụrụ ozi maka ịna ndị mmadụ ego MTN kwuburu na ndị ụlọakụ ga-akọwara ndị mmadụ maka atụmatụ a dịka ụbọchị na-aga. Gịnị bụkwanụ USSD a? Dịka Bekee si kwuo, "Unstructured Supplementary Service Data (USSD)" bụ ihe ndị mgbasaozi ekwentị na-eji ekesa ozi (text message) n'etiti ekwentị na ihe Bekee kpọrọ 'Application' maọbụ App n'ịchafụ. Ọmụmaatụ etu USSD si arụ ọrụ bụ etu a ụlọakụ GTB nwere *737# ị ga-ejinwu kwụọ ụgwọ maọbụ zụọ ihe na-efu. Mana atụmatụ ndị MTN wepụtara bụ nke a gọọmentị machiri, bụ na a ga-ana gị ego iji mee ya bụ ihe ego ị chọrọ ime na-ejighi App ndị ụlọakụ gị. Ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ya @MistaChika sị na ịgbanarị ya bụ ụgwọ USSD, na ọ kaara gị mma na i ji App gị na-akwụ ụgwọ ihe ọbụla. @_extreme kọwara na ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na ị nweghi "data" ị gaghị ejinwu ekwentị gị azụ ihe ọbụla dịka ego e ji akpọ n'ekwentị. Akụkọ ga-amasị gị: Nwoke dị afọ 100 si ụlọmkpọrọ pụta anwụọla Ọ bụ nwa nwoke! - Davido Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Abụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/egwuregwu-50103753
Man Utd ahụla Liverpool teta n'ụra ọnwụ
Ndị Manchester United bu ụzọ nye goolu
2019-10-20T17:27:55Z
Manchester United vs Liverpool: Man Utd ahụla Liverpool teta n'ụra ọnwụ
Ndị bọọlụ Liverpool tiwara ndị ji ha hibe isi maka imeri Manchester United obi taa, ka ha gazịrị bụrụ ndị na-asa goolu. Ọtụtụ ndị gụnyere ma ndị na-akwado Man Utd, chere na ha ga-eji goolu gbajuo ndị Man Utd afọ maka etu ahụ si ama ha ririri na bọọlụ kemgbe izu ole na ole gara aga. Jurgen Klopp na-agbara ndị Man Utd egbe ọnụ West Ham etiela Man United ka ịgba udubọnch Newcastle echiela Man United 'E cheta ebewe nke mbụ n'Ịngland' Mana ha bịara "teta n'ụra" n'azụ ụlọ ha na Old Trafford, wee sị ndị Liverpool "ọ bụghị taa!" ka egwuregwu mechara bie n'otu goolu otu goolu. Adam Lallana nke Liverpool ji ibu kara aka gbakaa neetị David De Gea na nkeji 85 na-erughi nkeji ise e webatara ya na bọọlụ, iji sata otu goolu Man Utd nyere ha n'ọkara nke mbụ. Lallana batara n'ọkara nke abụọ gbaa aka ahịa na-emeghị eme Marcus Rashford bu ụzọ bie Alisson "stamp" ka ọ gbakara neetị ya na nkeji 36 e ji bido bọọlụ. Maka etu goolu a si gaa, e mechara were ihe nkiri Video Assistant Refree (VAR) ji nyochaa ya, iji mara ma ọ dabara. Ka ọ dị ugbua, Man Utd esila n'ogogo 14 rigoro nke 13 na tebulu, ebe Liverpool ka nọkwa bụrụ ndị a na-emeribeghi kemgbe Premier League nke afọ a bidoro. Ihe ndị mmadụ na-ekwu: @Kheeng_jay na-ama ndị Man Utd njakịrị sị na ha si ebe ha zoro maka ụjọ mmeri na-arịpụta. @UgwunnaEjikem sị na ọ dị ka ike adịghị ndị Liverpool ịzọ ọkwa mbụ na Premier League nke afọ a, maka etu ha si atufu pọịntị. @ivanmerlo21 tinyere ihe na-egosi etu obi si dị ndị Man Utd pọlịna pọlịna oge Rashford nyere goolu ya. @AJno9 kwuru na ọ bụ ogbuopi ka e kwesịrị inye "ọkacha gbaa n'egwuregwu a". Akụkọ ga-amasị gị: Ọ bụ nwa nwoke! - Davido Nnamdi Kanu ebola ọnwụ nne ya n'isi ndịagha Naịjịrịa Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Egwuruegwu", "Premier League", "Liverpool F.C.", "Manchester United", "Bọọlụ" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50114921
Ihe mere Nnamdi Kanu ji gbuo oge ikwupute maka ọnwụ nne ya
Onyeisi otu akpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ekeleela ndị niile kasiri ya obi mgbe nne ya nwụrụ n'ọnwa Ọgọstụ, ma bo ọnwụ nne ya n'isi ndị agha Naịjirịa.
2019-10-21T05:09:09Z
Nnamdi Kanu: O bola ọnwụ nne ya n'isi ndịagha Naịjirịa
Nnamdi Nne onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra (Ipob)' bụ Ugoeze Sally Nmeme Kanu anwụọla. Nwa ya nwoke bụ Nnamdi Kanu kwuru na nne ya nwụrụ kemgbe ụbọchị iri atọ (30) nke ọnwa Ọgọstụ mana o bụ ụbọchị 20 nke ọnwa Ọktoba ka o kwuputara ya. 'Ọ fọrọ obere ka 'Egwu Eke II' loo Nnamdi Kanu - Buratai Nnamdi Kanu bụrụ dike ya maa ụkwụ n'ala Igbo - SERG N'ime onyonyo na-efegharị n'elu soshal midia, o toro nne ya maka etu o si kwado mbọ Ipob na-agba ịnweta Biafra mgbe ọ dị ndụ. Kanu kwuru na ọ bụ ihe mgbu na obi mgbawa si n'egwu eke ndị Naịjirịa mere n'afọ 2017 na be ha n'Afaraukwu dị n'Ụmụahia, Abia steeti, gburu nne ya. Ihe ndị Ipob kwuru maka ọnwụ nne Kanu Ụkọchukwu Chukwudi Peace gwara BBC Igbo na ọ bụ mgbe ọbụla sọrọ Kanu ka ọ ga-eji ekwupute ọnwụ nne ya makana onweghị onye ọ gbasara. O kwuru na ọ bụghị ihe ọhụrụ na Kanu ji ugbua ekwupute maka ọnwụ nne ya mere n'Ọgọstụ. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ nne Nnamdi Kanu Mberede okporoụzọ ejidela otu onye n'Ọnịcha Akụkọ si Ọnịcha eru anyị ntị na-akọwa na ụgbọala pịara otu nwaanyị gwogwo n'okporoụzọ e si abanye Ọmọba (bụ ebe ọkụ tanka gbara ụgbọala 22), na mgbede ụbọchị 20 nke ọnwa Ọktoba. Nwaanyị ahụ nke a na-amabgehi ma ọ nwụọla pịị tọgbọrọ n'okporoụzọ, mana ndị mmadụ gbara ya gburugburu na-ekwu na ọ nwụọla. Ndị mmadụ hụrụ ka ihe mberede a mere, kwuru na onye na-akwọ ụgbọala kụrụ nwaanyị a ka ọ na-achọ ịgbafe n'ụzọ, ma hapụ ya gbalaga ka ọ hụrụ ihe o mere. N'ihe nkiri si n'ọgbọ ahụ pụta, onye ntaakụkọ BBC hụrụ ka ndị ọrụ ha bụ ichekwa ụzọ nke a na-akpọ Federal Road Safety Corps (FRSC), gara ka ha mara ihe a ga-eme. Gọọmentị agwala MTN na ndị ọzọ kwụsị ịna ego maka USSD Ị na-eji MTN gị ekesa ego nke Bekee na-akpọ Bank Transfer? Ụjọ atụla gị makana ha agaghị ana gị ego USSD. Nke a bụ makana minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Isa Ali Pantami, enyela iwu ka ha gbaa brake ruo mgbe ọ tulechara ya, makana ọ sị na ọ maghị maka ya, nke o ji edo ya anya. Gụọ ya n'uju ebe a: Ụjọ atụla gị MTN agaghị ana gị ego USSD Ngagharịiwe ndị Hong Kong Ndị na-eme ngagharịiwe tụrụ mgbọ mmanụ agbịdị n'ụlọọrụ ndị uweojii N'ofesi, ndị mba Họng Kọng egosila na ha bụ isi ekwe ọnwụ dịka ha jụrụ ịkwụsị ngagharị iwe ha malitere kemgbe izu iri abụọ gara aga. Ọ bụ otu iwu ọhụrụ e wepụtara nke ga-eme ka e nwee ike ịkpọpụta ndị a na-enyo maka mpụ n'ike ma kpọba ha Chaịna, kpalitere ngagharịiwe a. Lee ndị meriri na Headies 2019 Ọ bụ Nancy Isime na oti egwu bụ Reminisce haziri emume Headies nke afọ a. Lee ụfọdụ ndị meriri nke afọ a. Ogụegwu nke afọ 2019. 'Burna Boy' Egwu kacha n'afọ 2019 'Burna Boy' Onye a na-atụanya ịkpa ike n'ọdịniihu 'Rema' Onye kacha emepụta egwu nke afọ 2019 'Killer Tunes' Ọgụegwu olu ya kacha mma 'Teni' Nchịkọta egwu n'afọ 2019 'Falz' Ihe onyonyo egwu kachasị 'Clarence Peters' Onye meriri 'Best Performer' Yemi Alade Ụlọ mkpagbu ọzọ ji mmadụ 147 na Kaduna Ufọdụ ndị azọpụtara bụ ụmụnwoke kwuru na awakporo ha Achọpụtala ụlọ mkpagbụ ọzọ ji ndị mmadụ otu narị iri anọ na asaa na Rigasa,nke dị na opkuru ọchịchị Igabi, Kaduna steeti. Ha dị ụmụnwoke otu nari iri anọ na asaa, ụmúnaanyị iri abụọ na abụọ ebe ọtụtụ ha bu ịga ma ụfodụ kwukwara na a na-awakpo ha n'ike. Ọ bụ Gọvanọ Kaduna steetị bụ Nasir El-Rufai na ndị uweojii soro zọpụta ndị a. Onyeisiala bụ Muhammadụ Buhari katọrọ mkpagbụ ndị a ma nye ndị nchekwa ikike ichopụta ndị ọzọ ebe ọbụla ha di. Enwetela Ọdụm gbapụrụ n'ogige a na-edewe anụmanụ na Kano Ọdụm bi n'ogige a na-edewe ụmụ anụmanụ dị na Kano agbapụla na-ebe edewere ya. Ndị na-elekọta ya sị na ọ bara ebe ewu nọ were nyere onwe ya aka ma rijuo afọ. Ha sị ka ndị mmadụ hara itu egwu n'ihi na ha anwụchiela ya bụ Ọdụm. Atọrọla otu onyeisi ndị uweojii Ndị ntọ ekwuola na ha chọrọ nde Naira iri ise tupu ha ahapụ onye uweojii na-achịkọta ndịuweoji na Suleja aha ya bụ Isa Rambo ha tọrọ. A tọrọ Rambo bụ onye eneyemaka Kọmishọna mgbe o si Kaduna a ga Jos na ụtụtụ Saturday. Ọnya Boko Haram amaala Boko Haram Ogbunigwe a na-eli n'ala Ọnya Ogbunigwe ndị Boko Haram liri n'ala egbuola ndị otu ha asaa ma mee ka asatrọ n'ime bụ daa ngwụrụ. Ọ bụ ebe ha na agba ọsọ dịka ndịgha Naịjiria na akwa ka mgbọ ka ụbgọala ha riri ya bụ ọgbunigwe elu. Nke a mere na ime ọhịa Lamb'a. Ka ọ dị ụgbụa, ndịagha NAijirịa na echekwa mpaghara a. N'Ofesi Brexit Onyeisiala mba Briten bụ Boris Johnson edegerala ndị EU akwụkwọ ka enye ha oge karịa ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Oktober maka Brexit. Nkea bụ maka iwu ndị omeiwu nyere ya, kama Boris Johnson degekwara ndị EU akwụkwo ọzọ were sị ha na Brexit igafe ụbọchi amara ọkwa ya dị njọ. N'Egwuregwu Asọmpi CHAN agbanagharịla ha Ndị otu sụper Eagles agaghi eso zọọ ikọ asọmpi 'African Nations Championship'nke afọ 2020 dịka ndị Togo ji ọkpụ goolu anọ ha satara atọ were gbapụ ha. Togo ji goolu anọ ha satara otu were merie ndị Super Eagles na agba nke mbụ maka ntozu asọmpị CHAN. Ndị Super Eagles na-atụanya na ha ga abụkwara ma nye goolu karịrị abụọ mgbe ha ga-ezute na Legos. Kama nke a bụ akụko ifo dịka ndị Akụko Ga-Amasị Gị Nwoke dị afọ 100 si ụlọmkpọrọ pụta anwụọla Ọkụ agbagbuola mmadụ atọ na Nnewi 'Ọrụ ga-amalite n'ọdọụgbọelụ Akanụ Ibịam n'abalị iri na-abịa' - Onyeisi na FAAN 'Tanka nsi bụ ihe menyụrụ ọkụ n'Onitsha' Nkeji Akụkọ Ihe Nkiri Ga-Amasị Gị
[ "Naijiria", "Ndị Biafra chọrọ nkewa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50122504
Edward Onoja bụzị osote Gọvanọ Kogi steeti
Edward Onoja aṅụọla iyi ọrụ dịka osote Gọvanọ Kogi Steeti
2019-10-21T08:43:00Z
Kogi State: Edward Onoja abụrụla osote Gọvanọ Kogi steeti
Edward Onoja ka ọ na-aṅụ iyiọrụ Edward Onoja aṅụọla iyi ọrụ dịka osote Gọvanọ nke Kogi steeti. Nke a mere dịka ndị ụlọomeiwu nke Kogi steeti nyochara ya were nye ya akara ntụrụugo ka ọ bụrụ osote Gọvanọ. Ọgbaghara na mwakpo agaghị azọpụta gị, Gọv Bello - PDP Aga m azọta oche gọvanọ Kogi state - Dino Melaye Ọ bụ ọkaikpe kachasị na Kogi steeti bụ Nasir Ajana duru ya n'iyi ọrụ n'ihu Gọvanọ Kogi steeti bụ Yahya Adoza Bello na ndị omeiwu ndị ọzọ. Cheta na nke a mere dịka ndị ụlọomeiwu nke Kogi steeti chụpụrụ Simon Achụba dịka osote onyeisiala maka omume ha sị rụru arụ n'abali atọ gara aga. E mere Achuba osote Gọvanọ n'ọnwa Febrụarị n'ime ọnwa ole na ole o si otu 'Peoples Democratic Party' were banye 'All Progressive Congress'. Idemmiri achụsasịala ndị bi n'Isheri na Legọọsi. Mgbe Gift Andrew onye ntaakụkọ BBC gara ji anya ya hụ ihe na-eme, ọ hụrụ na ndị mmadụ agbasasịala hapụ ụlọ ha niile maka idemmirị. Ndị bi ebe a ekwuola na ha enwebeghi ọkụ kemgbe oge tere aka. Ọtụtụ ndị bi ebe ahụ na-ebo gọọmenti na ha na-anara ụlọọrụ na-akụ azụ aka azụ iji dọtị oge ha kwesiri iji gbahapụ mmiri n'ebe eji mmiri emepụta ọkụ akpọrọ "Dam." BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ onyeisi "River Basin Authority" nke Ogun na Osun steeti mana onyeisi ngalaba ahụ bụ Olufemi Odufemi kwere anyị nkwa ịwepụta ọsịsa ya n'akwụkwọ ozi azabeghị anyị ruo ugbua. Ndịagha egbuola onye ntọ na Kaduna Ndịagha na-agbalị imegide ndị omekome ọkachasị n'okporo ụzọ Abuja-Kaduna Iko otu onye ntọ ejula dịka ndịagha gburu ya ma wakpo ogige abụọ ha si arụ ọrụ na Chikun dị na Kaduna steeti. O bụ Ezindu Idimah kwuchitere ndị nchekwa anya uhie uhie a bụ nke 'Operation Whirlp Punch' were sị na ha napụtara ndị nto a otu egbe, ogbatumtum atọ, n'ihe ndị ọzo. Gọọmenti etiti ebitela ego maka ọkụ latrịk Mịnịọ̀ta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed na onyeisi otu IMF bụ Christine Laggard Gọọmentị etiti na-ekwu na ha ka na-agbasi mbọ ike iji mee ka ọkụ latrik na-adị mgbe ọbụla na Naịjirịa. Iji mee nke a, Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed kwuru na ụlọakụ mba ụwa ekwela ibinye Naịjirịa ijeri dọla atọ. Mmepụta ọkụ latrik arịala Gọọmentị na ndị Discos na-ama aka onye mere Naịjirịa ejighi nwee ọkụ Ọkụ latrik agaghị enwu ọfụma ruo afọ 2023 - Ndị ọrụ latrịk Ahmed kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu mgbe e mechara nzụkọ nke ndị 'World Bank' na ndị 'International Monetary Fund' na-eme kwa afọ. Ọ kọwara na ego ahụ ga na-abịa na nkeji na nkeji bido n'ọnwa Eprel nke afọ 2020. Ahmed kwukwara na ego ahụ nwere ike ịrị ruo ijeri dọla anọ. A chọtala onye uweojii ndị ntọ tọọrọ Ndị uweojii agbapụtala otu onyeisi ha atọọrọ na Suleja, Niger state, na mgbede Satọọde. Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kwuru na ha tọhapụrụ onyeuweojii ahụ na mgbede ụbọchị ụka. O kwukwara na ha nwụchiri mmadụ abụọ a na-eche na ha so na ndị ntọ ahụ. Na Kaduna Akụkọ ka na-apụta na Kaduna ebe ndị uweoji tọhapụrụ mmadụ dị otu narị na iri anọ na asaa bụ ndị a kpọchiri n'otu ụlọ n'ụbọchị Satọdee. Ndị uweojii kwuru na ọtụtụ n'ime ndị ahụ bụ ndị atụrụ ịga n'ụkwụ na aka ihe karịrị afọ asatọ. Ha kwukwara na ha amalitela ịkpọghachi ha n'ezinụlọ ha. Ngagharịiwe na Chile Demonstrators clash with a riot police vehicle in Santiago Mmadụ ise nwụrụ na mba Chile mgbe ndị na-eme ngagharịiwe mụnyere ụlọorụ na-arụpụta akwa ọkụ n'ụbọchị ụka. Ngaghrịiwe a bụ maka mbuli e buliri ọnụego ụgbọ oloko. Ndị ọchịchị mba ahụ ebutuola ọnụ ego ahụ ka ọdịkwa ka ọ dị na mbụ, mana nke ahụ emeghị ka ngagharịiwe kwụsị. Ndị kpara opke agbụrụ Anwuchiela mmadụ abụọ bụ ndị nkwado egwu bọọlụ maka ikpa oke agbụrụ na asọmpi ntozu FA cup na etiti Haringey Borough na Yeovil Town n'Ingland. Agwa a rere ure mere ka akwụsi asọmpi a. Man Utd vs Liverpool Manchester United tetara n'ụra ụbọchị ụka na asọmpi ha na Liverpool nke biri n'onye lawa onye lawa. Liverpool che na ha ga-agwọ Man Utd ka abacha, mana ha chọpụtara na ọbụghị etu akị ilu si ada n'ọnụ ka o si atọ. Gere nkeji anyị Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Ihe mere Nnamdi Kanu ji gbuo oge ikwupute maka ọnwụ nne ya Ụjọ atụla gị MTN agaghị ana gị ego USSD Ọ bụ nwa nwoke! - Davido Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Kaduna steeti", "Naijiria", "Egwuruegwu", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "International Monetary Fund (IMF)", "Akụ na ụba", "World Bank" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50125103
'Itinye ego mgbazite n'ọkụ latrikị abụghị ihe kacha mkpa ugbua' - Sam Amadi
Onye ọkankuzi Sam Amadi kwuru na ọ ka mma ịhazịgharị ọnọdụ ịsesa ọkụ tupu ekwuwe okwu ego a ga-etinye na ya bụ ọrụ.
2019-10-21T13:15:16Z
World Bank Loan: 'Etinye ego a n'ọrụ ghara ịjụ ase, ihe na-ebe ga na-ebe' - Sam Amadi
Igwe ọkụ latrik Otụtụ ndị Naijiria na-atụ arịrị okpokpo ụgwọ ndị DISCO na-enye ha kwa ọnwa Ọ bụghịzị ihe ọhụru na gọọmenti Naịjirịa e bitela ego ruru ijeri dọla isii ($3B) bụ nke ha sị na-aga etinye n'ọkụ latrik iji mee ya ka ọ bụrụ anyụ anyụ. Minista na-ahụ maka okwu ego bụ Zainab Ahmed kwuputara nke a mgbe ha gara ọgbakọ ndị World Bank bụ ndị binyere Naịjirịa ya bụ ego, Ndị ọrụ ọkụ latrik agbaala abụbụ ọrụ Gịnị mere 'microphone' arụghị ọrụ taa n'ụlọomeiwu nta? Gọọmentị na ndị Discos na-ama aka onye mere Naịjirịa ejighi nwee ọkụ Kemgbe ahụ, ndị ọnụ na-eru n'okwu na ya bụ ọrụ na-enyocha ọnọdụ ya bụ ego mgbazite. Na mkparịta ụka ya na BBC n'ụtụtụ Monde, Sam Amadị, onye bụbu onyeisi ndị Nigerian Electricity Regulation Commission (NERC) sị na ọ bụghị ịnata ya bụ ego bụ ihe kacha mkpa. Kama na ọ bụ ịhazigharị ọnọdụ ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik nke a kpọrọ 'Distribution Company of Nigeria'. Amadị kọwara na NERC ekwubuola na ha ga-anapụ ndị 'Distribution Company of Nigeria' ikike n'ihi amaghị eme ha. O wee jụọ ma "ọ bụ ndị ahụ NERC kwuru na ha amaghị ọrụ ka a ga-enye ya bụ ego ka ọ bụ onye?' Ọkankuzi Sam Amadi bụbu onyeisi na Nigerian Electricity Regulation Commission ma bụrụkwa onyenkụzị na Mahadum Abuja Amadị kwuru na "gọomenti kwesiri ibu ụzọ gbanwee ndị DISCO a ọnụọgụ ha dị iri na otu tupu ha ekewe ya bụ ego ka ihe mere mbụ ghara ịme ọzọ". O kwukwara na gọọmenti ugbua kwesikwara ịjụ ajụjụ maka ego ndị a gbazitere mgbe gara aga. Amadị kọwara na gọọmentị kwesịrị ilebara nkesa ọkụ latrik anya nke ọma. Gọọmentị na ndị Discos na-ama aka onye mere Naịjirịa ejighi nwee ọkụ "Ọ bụrụ na edozie usoro ịbusa ọkụ (transmission) ghara ịdozi ụzọ esi ezịsa ya n'ụlọ ndị mmadụ (distribution), ihe na-ebe ga na-ebe", dika Sam siri kwuo. Ya mere o jiri dị mkpa na-ekwesiri ịkwadokwa ndị DISCO bụ ndị ọ bụ ọrụ ha izisa ya bụ ọkụ n'ụlọ ndị mmadụ. BBC gbakwara Okaiwu Sunday Oduntan bụ Ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ na-ezisa ọkụ latrik. N'onu ya, ya bụ ego dị mkpa ịnata ma ọ bụru na-aga etinye ya n'ọrụ dịka okwesiri maka na ọ ga-enye aka ka ọkụ a na-enye gbagota. Oduntan kwuru na kemgbe enyefere ndị nkịtị ọrụ ịzịsa ọkụ na ha enwebeghị uru na ya bụ ahịa. "Ụgwọ e ji DISCO ruru otu tarị naịra na ụma atọ (N1.3tn). Ọ bụru na-enye ha ego a, ọ ga-enyere ha aka ịgo akụrụngwa e ji enye ọkụ ma mee ka ọkụ dị gbanyụụ". Ọ kwekwara n'ezie na ọ bụrụ na etinye ya bụ ego n'ọrụ, na ọnụahịa ọkụ latrịk ga-arị nwamgbenta, mana ọ ga-emecha rituo n'ọdịnihu. BBC enweghị ike ịnwete ndị Mịnịstrị na-ahụ maka ego ka ha kwuo ka ha ga-esi kwụọ ya bụ ụgwọ mgbe e nwetere ya. Lee ihe nkiri a Akụkọ ga-amasị gị Jurgen Klopp na-agbara ndị Man Utd egbe ọnụ Amapụtala m ijeri naịra 10 maka ịrụzi ọdọụgbọelu Enugwu - Buhari Ụfọdụ nri ndị Igbo anaghị erikawazị
[ "Naijiria", "Ike" ]
https://www.bbc.com/igbo/50114923
"Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?'
Ọrụ ebidola n'ebe ụfọdụ ọkụ 'tanka' gbara n'Ọchanja dị n'Onịcha ebe ọtụtụ ndị na-arịọ ka gọọmenti gbatara ha ọsọ enyemaka.
2019-10-21T13:58:13Z
Onitsha tanker fire: "Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?'
Orụ ebidola n'ụfọdụ ebe ọkụ gbara n'Onịcha. Otu nwaanyị BBC Igbo hụrụ n'akụkụ ebe ihe mberede a mere kwuru na ọ bụ ụlọahịa ya na ụlọ obibi ka ọkụ a gbara. Ọ kwuru na ọ maghị ebe ọ ga-ebido ebido makana nanị akwa akwụkwọ ụmụ ya ka o ji pụta mgbe ọkụ a malitere gbawa.
[ "Anambra Steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50122507
Gịnị kpatara ndị ọkaiwu ji ekpu 'wig'?
Ndị ọkaiwu nwere ụdịrị okpu pụrụ iche ha na-ekpu, mana gịnị ka okpu a na-egosipụta?
2019-10-21T14:41:13Z
Lawyers' Wigs: Gịnị kpatara ndị ọkaiwu ji ekpu 'wig'?
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50132371
Anụmanụ Arsenal che na egbe ha ga-agbagbu eriela ha
Ndị Sheffield United anarala Arsenal ụra rahụọ
2019-10-21T21:07:44Z
Sheffield United vs Arsenal FC: Anụmanụ Arsenal che na egbe ha ga-agbagbu eriela ha
Sheffield emeriela ndị Arsenal Sheffield egosila na elelie nwa ite, ọ menyụọ ọkụ. Arsenal bidoro icha ndị sheffield ọkụ dịka asọmpị a bidoro mana ha amaghị na ogbu oge nwere 'Plans'. Nkata ekpudola Arsenal Arachaala Arsenal ka ofe nkupu Ọ bụ na nkeji iri na atọ ka Lys Mousset nke Sheffield sụkara netị ndị Arsenal. Arsenal chọrọ goolu ọnwụ-ọnwụ nke mere ka Bukayo Saka chọrọ i ji aghụghọ nweta Penaltị ma ogbuu bọọlụ hụru arụrala ya were kadị odo odo saa ya ahụ. Arsenal ewerela 'chizoba' zaa aha nna ha Liverpool asụọla atịkpa fenye Tottenham ajụ n'anya Arsenal gbalịrị ike ha ma ndị otu Sheffield ji gwongworo dọchie ọnụ postu ha. Ka ọ dị ụgbụ a, ndị Arsenal ji akara atọ aga ndị Sheffield kama ha etufuola ohere i so na otu anọ kachasị. Mmeri a bụ mmerị kacha daa ụda ndị Sheffield meriri kamgbe ha lahachịrị na Premiership. Sheffield bụzị ndị nke itolu na Premiership dịka ha jị akara anọ agbanagharị ị pụ na Premiership. Mana otu ihe doro anya bụ na ndị nkwado otu bọolụ Sheffield ka eme ezigbo mmemme taa. Akụkọ ga-amasị gị Edward Onoja bụzị osote Gọvanọ Kogi steeti 'Itinye ego mgbazite n'ọkụ latrikị abụghị ihe kacha mkpa ugbua' - Sam Amadi Ihe mere Nnamdi Kanu ji gbuo oge ikwupute maka ọnwụ nne ya Nwoke dị afọ 100 si ụlọmkpọrọ pụta anwụọla Ihe nkiri ga-amasị gị
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50135780
'Onye anwakwala anwa kpọọ m onye Yoruba ọzọ'- FFK
Femi Fani Kayode akpọọla oku ka ndị agbụrụ ya jụ aha ndị ọzọ boro ha.
2019-10-22T05:46:32Z
'Onye anwakwala anwa kpọọ m onye Yoruba ọzọ'- FFK
fani kayode Onye bụbu minista na ahụ maka njem ụgbọelu bụ Femi Fani Kayode akwọọla aka Pontus Pirate n'isi aha ndị Yoruba. Nwaamdị ahụ eji FFK mara sị na ọ bụ ndị Fulani nyere ha aha ahụ, nke ha kpọrọ Yariba n'olu ha. Nnamdi Kanu: Abaribe na Fani-Kayode ga-agwa anyị ka o si gbapụ na Naịjirịa - Ọkaiwu Lee aha ndị gọọmenti etiti machiri njem mba ofesi Ọ sị na ndị Fulani ji ya bụ aha eme ndị agbụrụ ya akaje maka na ya bụ yariba pụtara " muchi muchi na Onye ihu abụọ". FFK sị na "agbụrụ m abụghị ndị muchi muchi maọbụ ndị ihu abụọ". FFK sịkwa na ọ bụ otu aka ahụ ka ha sị akpọ ndị Igbo Yamiri. Ebe ndị Igbo jụru nke ha, ndị Yoruba nabata nke ha. Ọ sị na agbụru ya bụ "Karo Jire" maọbụ "Oduduwa", ebe asụsụ ya bụ Anago. FFK sị onye anwakwala anwa kpọọ ya onye Yoruba ma kpọkụọ ndị agbụrụ ya niile ka ha jụ aha ahụ kpam kpam. Ọ sị na onye ọbụla na-aza aha ahụ site ugbua "amaghị ihe ọ na-eme onwe ya na ndị agbụrụ ya niile". N'otu aka ahụ FFK kọtọkwara aha Naịjirịa n'akara twitter ya bụ nke ọ sị na ọ bụ ndị Bekee nyere ha aha ahụ nke ọ sị na ọ pụtara "obodo ọchịchịrị". Ọ sị na aha ndị ahụ bụ mkparị nye ndị agbụrụ ha ma sị onye ọbụla azazịla ya. AKụkọ ga-amasị gị Ihe mere Nnamdi Kanu ji gbuo oge ikwupute maka ọnwụ nne ya Nwoke dị afọ 100 si ụlọmkpọrọ pụta anwụọla Edward Onoja bụzị osote Gọvanọ Kogi steeti
[ "Naijiria", "Omenala", "Ndọrọndọrọ ọchịchị" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50114925
Bobrisky o ji ike dimkpa kụpụ nwoke suru ụgbọala ya ntị?
Ihe nkiri na-efegharị na soshal midia na-egosi Okuneye Idris Olarenwaju ama dịka 'Bobrisky' ebe ọ na-alụ ọgụ maka etu nwoke ọzọ si sụọ ụgbọala ya.
2019-10-22T05:48:24Z
Bobrisky: Ọ lụrụ ọgụ ka nwoke ka-e suru ụgbọala ya?
Bobrisky Onye a ma ama maka iyi efe ma na-etecha ntecha ụmụnwaanyị bụ Bobrisky egosila ihe o ji bụrụ dimkpa site n'ịlụsa nwoke suru ụgbọala ya ọgụ. Bobrisky, onye ezigbo aha ya bụ Idris Olarenwaju, depụtara n'akara Twitter ya na ya gakwaara onwe ya ọgbakọ mgbe nwoke ahụ ji ụgbọala ya suo nke ya. 'Anyị ga-agbachi ụlọahịa anyị niile n'Enugwu steeti' Uche Ogbodo o mere arụ n'ịgba ọtọ see foto? Mana Idris kwuru na okwu bidoro mgbe nwoke ahụ bidoro mawa ya aka n'ihu jụwa ihe ọ pụrụ ime ya. O kwuru na o mesiri nwoke ahụ ike ma gosi ya na ọ bụghị ya ka a na-amara aka. Gụọ ihe o dere n'uju ebe a. Nwoke ahụ agbarala ọsọ rịọ Bobrisky mgbahara. Ụmụ mmadụ na-ekwu ọtụtụ ihe maka ihe mere na soshal midia. @Blessyn_coco kwuru na isi ndo ezughi. @Haryordeylaymi kwuru na ihe a gbagọjuru ya anya. Bobrisky bụbu nwoke mana ọ na-ekwusi ike na ya bụzi nwanyị ugbua. Akụkọ ndị ga-amasị gị Edward Onoja bụzị osote Gọvanọ Kogi steeti Anụmanụ Arsenal che na egbe ha ga-agbagbu eriela ha
[ "Ịkpa obi aṅụrị", "Naijiria" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50104868
Lee ihe akụ ọnatarachi jupụtara n'Enugu State
'Coal' so n'otu akụ ọnatarachi e ji mara Enugwu Steeti, mana ọ bụghị sọ ya.
2019-10-22T07:04:47Z
Enugu State: Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n'Enugu State
Coal Coal A ma Enugwu Steeti ama dịka isi obodo mpaghara ọwụwa anyanwụ Niajiria. Otu ihe akụ ọnatarachi e ji mara Enugwu bụ 'coal'. N'oge mbụ 'coal' nke e si n'Enugwu egwupụta so n'otu ihe na-enye Naịjirịa nnukwu ego. Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n'Ebonyi State Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti Lee ọtụtụ ihe akụ ọnatarachi juputara n'Abia State nke nwere ike ime ha ọgaranya Mana ọbụghị sọ 'coal' bụ ihe akụ ọnatarachi dị n'Enugwu. Lee ndị ọzọ dịka ngalaba dịka 'Raw Materials Research & Development Council' si depụta. 1) Coal 'Coal' Coal bụ unyi pụrụ iche e si' nala egwupụta. E ji ya emepụta ọkụ latrik, jirikwa ya akwọ ụgbọ okporoigwe Bekee kpọrọ 'train'. 'Coal' bụ ihe e ji mara Enugwu steeti, nke mere e ji akpọ ya 'Coal city'. N'Enugwu North na South ka 'Coal bara ụba. 2) Gypsum Ọgba ebe 'gypsum' jupụtara Gypsum bụ ụdị nkume dị nro e si n'ala egwupụta. Ọ naghị esicha ike ka nkume ndị ọzọ. Ihe e ji ya arụpụta dị ụbara. Ha gụnyere nzu bekee a kpọrọ 'chalk', ọgwụ, nakwa 'Plaster of Paris' (POP). E jikwa ya eme ka ala dị mma maka ịkọ ihe. Na mpaghara Ezeagu ka e nwere 'gypsum' nke ọma. 3) Iron-Ore Ọbụ 'Iron ore' ka e ji arụpụta rọọdụ e ji arụ ụlọ 'Iron ore' bụ ihe dị ka nkume e si n'ala egwuputa nke e ji emepụta igwe na ihe ndị ọzọ. Ọbụ 'Iron ore' ka e ji arụpụta rọọdụ e ji arụ ụlọ nakwa igwe e ji arụ akwa mmiri nke Bekee kpọrọ 'steel'. Onye gaa na akụkụ Udi, Igboeze North nakwa South, ebe ahụ ka 'Iron ore' jupụtara. 4) Glass Sand Nke a bụ aja pụrụ iche nke e nwere ike ịgbaze iji mepụta 'glass'. Ihe e ji 'glass' arụpụta karịrị akarị. Nke a mere ka 'glass sand' bụrụ akụ ọnatarachi pụrụ iche. Na Udi nakwa Uzo-Uwanị ka ị ga-ahụ 'glass sand' n'uju. 5) Silica Sand 'Silica Sand' 'Silica sand' bụ aja pụrụ iche na-egbuke egbuke nke e ji eme ka ụlọ sie ike. O sokwa na akụrụngwa e ji emepụta 'cement'. Ahịa 'silica sand' na mba ụwa niile ruru ijeri dọla asaa na ụma anọ n'afọ 2018. A na-atụ anya na ọ ga-eru ijeri dọla iri na ụma ise n'afọ 2024. Ebe a ga-ahụ 'silica sand' bụ na Enugwu South, Igboeze North na South na Isiuzo. 6) Laterite E ji laterite arụ ụzọ Ihe e ji 'laterite' emepụta dị ọtụtụ. Ha gụnyere ịrụ ụzọ nakwa ịkpụ ihe ọkpụkpụ. Na mpaghara Awgu, na Igboeze North na South ka e nwere 'laterite' kasị mma n'Enugwu. 7) Pyrite Pyrite 'Pyrite' bụ igwe na-egbuke egbuke. Ndị ọkacha mara na-ekwu na ebe ọbụla a hụrụ 'Pyrite', ọlaedo nwere ike ịdịkwa ebe ahụ. Ọbụkwa kịrịkịrị ọlaedo ahụ na-adị n'ime 'pyrite' mere o ji ada oke ọnụ ahịa. E ji ya emepụta mgbaolu, mgbaaka, naọla ndị ọzọ e ji acọ mma. 'Pyrite' dị nke ọma na mpaghara ụfọdụ n'Enugwu South. 8) 'Ball Clay' Ụdị aja ụrọ a na-ama mma n'anya n'ihi ọcha ya. 'Ball clay' bụkwa otu akụrụngwa e ji emepụta 'ceramics'. Mpaghara e nwere 'ball clay' nke ọma bụ na okpuru ọchịchị Isi Uzo. 9) Copper 'Copper' 'Copper' bụ ụdị igwe pụrụ iche. A na-agụkọ ọla edo, ọla ọcha na 'copper' ọnụ. Uru 'copper' bara dị ọtụtụ. Agwakọọ 'copper' na 'aluminium' maọbụ 'zinc', ihe a ga-enweta bụ 'bronze'. Nkanu East na West bụ ebe e nwere 'copper'. 10) Ndị ọzọ Enugwu bụkwa obodo na-emepụta nri nke ọma. Ha nwekwara ihe nlere anya dị iche iche dịka ọgba, ugwu, ọdịda mmiri nke Bekee kpọrọ 'water fall'. N'otu aka ahụ kwa, mmepụta ejije bụkwa ihe ọzọ e ji mara Enugwu. Ọbụ ebe ahụ ka a na-anọ emepụta ọtụtụ ihe ejije 'Nollywood'. Ọ bụrụ na gọọmentị etit nakwa nke steeti elebaa ihe ndị a anya, Enugwu ga-abụ ụwa bịa lelee. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n'Ebonyi State Lee ọtụtụ ihe akụ ọnatarachi juputara n'Abia State nke nwere ike ime ha ọgaranya Lee ihe akụ ọnatarachi juru n'Anambra steeti Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Enugu Steeti", "Akụ na ụba", "Enugwu" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50122506
Gịnị kpatara ndị ọkaiwu ji ekpu 'wig'?
Ndị ọkaiwu nwere ụdịrị okpu pụrụ iche ha na-ekpu, mana gịnị ka okpu a na-egosipụta?
2019-10-22T07:19:43Z
Lawyers' Wigs: Gịnị kpatara ndị ọkaiwu ji ekpu 'wig'?
Osote onyeisiala Yemi Osinbajo na ndị ọkaikpe Ịbụ onye ọkaiwu so n'otu ọrụ kacha nwee ugwu n'ụwa. Ndị ọkaiwu bụ ndị a ma dịka ndị ma oke akwụkwọ ma burukwa iwu obodo niile n'isi. Buhari achụola ndi ọkaiwu ukwuu abụọ 'O nweghi ihe ghọrọ Onnoghen ahịa' Ekike e ji mara ndị ọkaiwu na-apụkwa iche ma nwekwaa mpụtara dị icheiche. Ekike ndị a gụnyere uwe ogologo ojii na okpu ọcha a na-akpọ 'wig'. Gịnị ka okpu ndị ọkaiwu pụtara? Okpu ndị ọkaiwu Nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na ọbụ na mba Ịngland ka ụdị ekike ahụ malitere. N'oge ahụ, ọbụ naanị ndị ọgaranya na-ekpu okpu pụrụ iche iji gosi akụnụba ha. Ọbụkwa ndị ọgaranya na-abụkarị ndị ọkaiwu n'oge ahụ, nke a mere na ha na-eyi uwe ogologo ma kpurukwa okpu pụrụ iche. Mana ugbua, n'obodo ndị mepere emepe n'akụkụ ụwa niile, ndị ọkaiwu anaghịzi ekpu ụdị okpu ahụ. Ọ ka mma ka emelaa okpu ndị ọkaiwu a na Naịjirịa? BBC Igbo gbara otu onye ọkaiwu aha ya bụ Amara Nwabueze ajụjụ ọnụ. Nwabueze bụkwa onye nkuzi na ngalaba iwu na Mahadum Abiịa Steeti. O kwuru na ọbụ eziokwu na ekpomọkụ buru ibu na Naịjirịa, mana nke ahụ ezughị iji sị ka akwụsị ya. O kwuru sị: "Ịbụ ọkaiwu bụ ọrụ nwere nnukwu ugwu, o kwesịrị ka a na-akwanyere ya ugwu." "Ọbụrụ na a sị onye ọbụla yiri ihe dị ya mma bịawa n'ụlọikpe, ndị mmadụ ga-emechu ugwu a na-akwanyere ọrụ ọkaiwu." Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia Ụfọdụ na-ekwu na Naịjirịa ekwesịla ịgbajọ okpu nakwa uwe ogologo ndị ọkaiwu na eyi. Ọkaiwu Chidi Odinkalu kwuru okpu ahụ adịghị mma maka ahụike mmadụ n'ihi oke ekpomọkụ dị na Naịjirịa. Ike Aguata kwuru na ihe izi ọ ga-eme ma o nwee ohere bụ ịkwụsị ya bụ uwe ogologo nakwa okpu. Mana @effe_ndi kwuru na ndị ọkaiwu na mba UK ka na-ekpukwa okpu ahụ ma abịa n'ikpe dị aghaa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Anyị ebitela ijeri dọla atọ maka ọkụ latrik - Gọọmentị etiti 'Itinye ego mgbazite n'ọkụ latrikị abụghị ihe kacha mkpa ugbua' - Sam Amadi 'Idemmiri achụsịala anyị' Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Ikpe" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50136581
Ndị agha Naịjirịa agbakịrịla nwaanyi dị ime egbe
Nafiu Muhammad bụ anya hụrụ ọdachị a mere gwara BBC na ụfọdụ ndị agha Naịjirịa bịara na Mabera dị Sokoto ịbọgwara mkparị e nyere ọyị nwaanyị otu onye n'ime ha.
2019-10-22T08:44:22Z
Sokoto killings: Ndị agha Naịjirịa agbakịrịla nwaanyi dị ime egbe
Ndị agha Ndị agha Naijịrịa na-eme kari ngosi ike ma ọbụru na okwu ndị Ụfọdụ ndị otu agha Naịjirịa egbuola ndị ha kwuru kparịrị ọyị nwaanyị otu onye n'ime ha. Anya hụrụ mgbe ihe a mere Nafiu Muhammad gwara BBC na ya bụ ihe mere n'elekere asọtọ n'ụma na mgbede na Mabera dị na Sokoto. Ndị uweojii asaala ndị agha okwu maka ndị uweojii atọ ha gbagburu ma tọhapụ onye ntọ Egbuola ndị Boko Haram 5 na Sambisa Muhammad kwuru na okwu kawanyere njọ mgbe ndị otu Nigerian Airforce bidoro gbasasiwa egbe ka igwe mmadụ ghara ibiagbu ha. Nke a mere ka mgbọ egbe ntụsasi gbata ọtụ nwaanyị dị ime ma mụgọro ụmụ asaa nakwa otu okorobia ma gbuo ha. Ndị okenye kwuru na ha ga-enyocha ozu ahụ ka ha matakwuo ka ha si nwụọ tupu ha nie ha. Messi ọ ga-amabụrụ Ballon D'or nke afọ 2019 Messi enwetela nturuugo Ballon d'or ugboro ise Lionel Messi nwere ike ituru ugo ọzọ dịka ọkacha agba bọọlụ n'ụwa niile. Aha ya so na ndị ahọpụtara maka inweta nturuugo 'Ballon D'or' nke afọ 2019. Messi abụrụla 'GOAT' ndị FIFA ọzọ Ballon d'Or: Luka Modric anarala Messi na Ronaldo ụra Akụkọ kachasị n'ụtutu a: Lionel Messi na Cristiano Ronaldo 'akwakọrọla pụọ' n'asọmpi Iko Mbaụwa Cheta na ọbụ Messi ka e chiri eze bọọlụ nke ndị otu na-elekọta egwuruegwu bọọlụ bụ Fifa. Ndị ọzọ aha ha so na ndị a na-atule maka nturuugo ahụ bụ Cristiano Ronaldo na Virgil Van Dijk. Cristiano Ronaldo enwetekwala nturuugo Ballon d'or ugboro ise. Ronaldo na-agbara otu egwu bọọlụ Juventus nakwa mba Pọtụgal ebe Van Dijk na-agbara ndị Liverpool nakwa mba Nedalands. Luca Modric, onye otu egwu bọọlụ Real Madrid, bụ onye tuuru ugo 'Ballon D'or' nke afọ gara aga. Mana aha ya esoghị chaachaa na ndị nwere ike irite nke afọ a. Nwaafọ Igbo bu Samuel Chukwueze sokwa na mmadụ iri ahọpụtara aha ha dịka ndị ntorobịa kacha agba bọọlụ n'ụwa. Na abalị abụọ nke ọnwa Disemba ka a ga-ekwupụta onye tuuru ugo 'Ballon d'or' nke afọ 2019. Sowore ọ ga enwere onwe ya? Ụlọikpe dị n'Abuja ekwugharịala ihe Omoyele Sowore ga-eme tupu atọhapụ ya na nga ndị DSS ebe e ji ya kamgbe ọnwa Ọgọst. Ụlọikpe ahụ kwuburu na onye ọbụla ga-agbara Sowore akaebe tupu atọhapụ ya ga-akwụ nde naịra iri ise, mana ugbua ha akụchapụla nke ahụ. Sowore bịa zara ọnụ ya maka ntọghapụ n'October 4 - Ụlọikpe Ụlọikpe sị ka a tọhapụ Sowore Ụlọikpe enyela iwu ka atọhapụ Omoyele Sowore Mana ụlọikpe kwụsịrị ike na mkpebi ya na Sowore agaghị esi Abuja pụọ ma a tọhapụ ya. Uloikpe ahụ butukwara ego ha kwuru na Olawale Baka re ga-akwụ tupu a tọhapụ ya. Bakare bụ onye a nwụchiri ya na Sowore otu oge. A na-ebo ha abụọ ebubo na ha kparịrị onyeisiala Muhammadu Buhari ma na-achọkwa ụzọ ịchutu ya n'ọkwa. Saraki na EFCC Bukola Saraki Na nke dịka ibe ya, dịka ụlọikpe na Legọs nyere iwu ka gọọmentị etiti weghara ụlọ Bukola Saraki, Saraki na-ekwu na egwu ọbụla adịghị atụ ya. Saraki kwuru na ọbụ nghọgbu ka ndị EFCC ghọgburu ụlọikpe ahụ n'ihi na ụlọikpe kachasị na Naịjirịa ekwubuola na aka ya dị ọcha. O kwuru na ya agwala ndị ọkaiwu ya ka ha ga gbaghaa iwu ahụ ụlọikpe Legọs nyere na mgbede Monde. Na Canada Justin Trudeau oge ọ na-eme njem ịchụ nta vootu A na atụ anya na otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke onyeisiala mba Canada bụ Justin Trudeau ga-eturu ugo na ntuliaka nke na aga n'ihu na mba ahụ ugbua. Mana Trudeau ga achọ enyemaka ndị patị nke ọzọ n'ihi na pati ya enwezuchaghị vote ole a tụrụ anya n'aka ha. Arsenal ndị ọnyụpa E lelịa nwa ite ọ gbọnyụọ ọkụ. Otu a ka ndị egwu bọọlụ Sheffield United si were otu ọkpụ goolu dulaa ndị Arsenal na abalị Mọnde. Hahahaha.... Arsenal ndị ọnyụpa. Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n'Enugu State Gịnị kpatara ndị ọkaiwu ji ekpu 'wig'? Anụmanụ Arsenal che na egbe ha ga-agbagbu eriela ha Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Canada", "Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa", "FIFA", "Bọọlụ", "Bukola Saraki" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50142432
Ije Rochas na nnyocha gọọmentị Imo steeti na-eme ya
Ihe Rochas Okorocha kwuru maka nnyocha gọọmentị Imo steeti na-enyocha ya.
2019-10-22T12:51:47Z
Ihe Rochas Okorocha kwuru maka nnyocha gọọmentị Imo steeti na-enyocha ya
[]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50138262
Ka ị ga-esi gbanahụ "ọdịda n'ike" na-ebute ọnwụ
Dika a na-enweta akụkọ ndị mmadụ na-anọkata daa nwụrụ, dibia bekee bụ Chidimma AkagaKwuru ihe ole na ole nwereike ịkpata ya bụ ọdachị nakwa ogbugbo ya.
2019-10-22T13:32:47Z
Healthy living: Ka ị ga-esi gbanahụ 'ọdịda n'ike' na-ebute ọnwụ.'
Onye dara ada Dika a na-enweta akụkọ ndị mmadụ na-anọkata daa nwụrụ, ọ na-agbagọjụ ụfọdụ anya etu dimkpa maọbụ agada agada nwaanyị ga-esi nọkata daa ma nwụrụ. Dibia bekee bụ Chidimma kwuru ihe ole na ole nwereike ịkpata ya bụ ọdachị nakwa ogbugbo ya. Dọkịta egbuola nwaanyị otele ukwu gbalaga Ihe ụfọdụ ụzọ ndị ahụ dọkịta Chidimma kpọpụtara. 1.Oke ndọli: O kwuru na nsogbu a na-emekarị n'etiti ndị ọgbara ọhụrụ a na-adọlị n'ime oke ahụhụ ịkpata ihe ọnụ ga-eri. Ogbugbo: Nwete ezumike zuruoke. 2. Oke ọbara mgbalielu: Ogbugbo: Na-anwụ ọgwụ ga-ebutedata ya nke dọkịta gị ji aka ya nye gị. 3. Oke ọbara mgbatu ala: Ọgbugbo: Lele ahụ gị n'ime ọnwa isii ọbụla ka ịchọpụta nke a ma nata ndụmọdụ zuruoke n'aka dọkịnta gị 4.Afo ime: Dọkịta Chidimma kwuru na ndị ime nwereike ịda mgbe ọbụla. Ogbugbo: Nata dọkịta gị ndụmọdụ ma ịchọpụta na ị na-adakarị ma ị dị ime. 5.Anwụghị mmiri: Nke a pụtara na onye ahụ anaghị aṅụ mmiri ọfụma. Ogbugbo: Dọkịnta Chidimma kwuru na ọ ga-adịmma ka mmadụ na-agba mbọ hụ na ọ na-aṅụ mmiri ugboro gboro n'ụbọchị 6. Oke egwu Ogbugbo: Ihe hija gị n'ike ,jide obi aka. 7. Oke ụfụ Ogbugbo: Nabata ọgwụ dọkịta gị nyere gị maka nke a 8. Etu isi ekulite n'ụra: Dọkịta Chidmma kwuru na etu mmadụ si ekulite n'ụra nwerike ịkwatụ ya n'ike maọbụrụ na omeghị ya ọfụma. Ogbugbo: Ikulite n'ụra, tụgharịa n'akụkụ gị nọrọ oge tịnkọm tịnkọm, nọrọala oge tịnkọm tịnkọm, chituo ụkwụ gị n'ala oge tinkọm tịnkọm ma rituo n'oge na-adịghị anya n'elu akwa. N'ikpeazụ dọkịnta Chidimma kwuru na ọ ga-adị mma ka mmadụ na-ewepụta oge na-aga na-enyocha ahụ ya opekatampe otu ụbọchị n'ime ọnwa isii. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Lee ihe akụ ọnatarachi jupụtara n'Enugu State Agu Messi a ga-eturu ugo 'Ballon d'or' nke afọ a? Gịnị kpatara ndị ọkaiwu ji ekpu 'wig'? Bobrisky o ji ike dimkpa kụpụ nwoke suru ụgbọala ya ntị?
[ "Naijiria", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50142431
'Gọọmentị Imo na-aba mba ka ụmụaka'
Ihe ejije na-eme na gọọmentị Imo steeti kamgbe Rochas pụrụ n'ọchichi na-ebute ọtụtụ okwu na ụka.
2019-10-22T14:39:01Z
250 Account Probe: Gọọmentị Imo na-akpa agwa ụmụaka ọtaakara - Rochas Okorocha
Rochas Okorocha Gọọmenti Imo steeti na enyocha Rochas Okorocha Ndị ụlọomeiwu Imo steeti enyela ikike ka enyocha akara ọba ego narị abụọ na iri ise emepere mgbe Rochas Okorocha bụ Gọvanọ Imo steeti. N'aka nke ọzọ, lekwa ihe Rochas Okorocha nwere ikwu maka nyocha Gọọmenti Imo steeti na-enyocha ya. Onyeomeiwu Imo steeti bụ Uche Ogbuagu kwuru na nyocha a bụ ka achịkọtaa ọba akụ ndị a ka ha bụrụ otu. Foto:Onye kuturu akpụrụakpụ 'Akachi'? Ihe ọbụla EFCC chọrọ ime ha mee ya dịka iwu siri kwuo- Rochas Okorocha Ihe nke a pụtara bụ na ha ga enyocha ọba ego ndia niile ka ha mara nke ego dị ma nke ego na adịghi. Ogbuagu kwuru na mgbe ha mechara ka ha ga-achịkọta ọba ego ndị a n'ihe ndị bekee na-akpọ 'Single Treasury account'. 'Ndị kọmitii gọọmenti Imo steeti ji akwụkwọ ikike adigboroja' - Uloma Rochas Nwosu Anyị ga-enyocha mpụtara mkpebi ụlọikpe n'okwu Okorocha - Inec Ndị omeiwu a rịọrọ ka ndị Ụlọakụ nwe oba egoi ndị a nyere aka ka atụmatụ a gaa nke ọma. Akụkọ Ga-Amasị Gị Lee ihe akụ ọnatarachi jupụtara n'Enugu State Bobrisky o ji ike dimkpa kụpụ nwoke suru ụgbọala ya ntị? Gịnị kpatara ndị ọkaiwu ji ekpu 'wig'? 'Onye anwakwala anwa kpọọ m onye Yoruba ọzọ'- FFK Ihe Nkiri Ga-Amasị Gị
[ "Ụlọakụ", "Imo steeti" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50142434
Lekwa akụrụngwa ịkwọ aka na-ewu n'Enugu
Dịka emere ụbochị ncheta maka ịkwọ aka, nwunye gọvanọ Enugwu steeti bụ Monica Ugwuanyị gaara gbapee ngwa ụmụakwụkwọ rụru ha ji akwọ aka.
2019-10-22T16:01:50Z
Enugu first lady: Monica Ugwuanyị agbapeela ngwa e ji akwọ aka
Iji were sonye mba ụwa niile na mmemme ejị akwọchapụ aka nke ọma, a kpọrọ "Global hand washing day" nwunye gọvanọ Enugwu bụ Monica Ugwuanyị gbapere ihe ejị akwọ aka n'ụlọakwụkwọ Amechi prịmarị n'Enugwu. Mgbe BBC Igbo garuru ya bụ ụlọ akwụkwọ n'Amechi dị n'Enugwu south LGA iji hụ ka ụmụ akwụkwọ sị eji ya bụ akụrụngwa akwọ aka. Otu n'ime nkarangwa nwunye Gọvano gara gbapee Otu onye nkuzi gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ ụmụ aka jiri aka ha rụọ ya bụ ngwa ọrụ. Ha bupụtara osisi, galọnụ, eriri, ncha, kedo ya ma gosi anyị ka esi akwọ aka. Mana onye nkuzi onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ kọwara na ihe mere ha jiri wepụsịa ya bụ osisi akụrụ bụ n'ihi na osighi ike na ala nke mere na ụmụ akwụkwọ na akwatu ya. Okwu 'bịa banye otu nzuzo' ataala isi otu onye Ihe Enugu state ji bụrụ 'baby ọkụ' mma zuru ahụ Ya bụ ihe dum e ji akwọ aka dị ngalaba anọ na ya bụ ụlọ akwụkwọ adịghịzị ebe ha kwesịrị. Lee ihe akụ ọnatarachi jupụtara n'Enugu State 'Anyị ga na-arụpụta mkpịsị odee nde 15 kwa afọ n'Enugu' Lee mmadụ ole egburu maọbụ tọrọ n'Enugwu steeti na nsonso a 'Anyị amabeghi onye gburu onye nkuzi mahadum' Ụmụ ntakịrị ahụ bupụtara osisi, galọnụ, eriri, ncha, kedo ya ma gosi anyị ka esi akwọ aka. Onye nkuzi BBC Igbo gakwụrụ ebe ahụ gwara anyị na ọ bụrụ na gọmenti ga arụrụ ha akụrụngwa ọgbara ọhụrụ eji akwọ aka, na ọ ga-abara ha uru nke ukwuu karia nke gbanụ gbanụ a ha jị eriri ekedo. Ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ya Nwaada sị na obi adịghi ya mma maka mgbape a nwunye Gọvanọ mere @TeeHotSpot kwukara na obi adịghị ya mma. Akụkọ Ga-Amasị Gị Lee ihe akụ ọnatarachi jupụtara n'Enugu State Gịnị kpatara ndị ọkaiwu ji ekpu 'wig'? Bobrisky o ji ike dimkpa kụpụ nwoke suru ụgbọala ya ntị? 'Onye anwakwala anwa kpọọ m onye Yoruba ọzọ'- FFK Ihe Nkiri Ga-Amasị gị
[ "Naijiria", "Ọmụmụ na mmụta", "Ụmụaka", "Ahụike" ]
https://www.bbc.com/igbo/media-42986440
BBC Nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla.
2019-10-22T16:59:06Z
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla
[ "Naijiria", "Egwuruegwu", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50198703
Allen Onyema emekwaala ihe nyịrị mmụọ na mmadụ
Onyeisi ụlọọrụ Airpeace bụ Allen Onyema ekpeziela udo n'etiti gọvanọ Benue steeti na ndị Miyetti Allah.
2019-10-27T08:37:57Z
Fulani herdsmen crisis: Allen Onyema emekwaala ihe nyịrị mmụọ na mmadụ
Akụkọ ndị dị mkpa Air Peace ekpeziela udo n'etiti Miyetti Allah na Benue steeti Allen Onyema, Saleh Alhassan, Sammuel Ortom Gọọmenti Benue steeti ekwuola na ndị otu Miyetti Allah arịọla ndị steeti ahụ mgbaghara maka oke ogbugbu nsogbu dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọru ụgbo butere na steeti ahụ. Ihe 5 Allen Onyema gwara Nnamdi Kanu 'Onye ọbụla na-ebu ọgwụ ike na-egbu ndị mmadụ' - Onyeisi Air Peace Ode akwụkwọ Miyetti Allah n'ogo federalụ bụ Saleh Alhassan gosiri oke nwute maka oke ogbugbu nsogbu a dị n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo na-ebute ma kwe nkwa ime ka mkpezi udo a tọ atọ. Ọ bụ onyeisi ụlọrụ njem ụgbọelu Airpeace aha ya bụ Allen Onyema kpeziri udo a n'etiti Miyetti Allah na Gọvanọ Samuel Ortom na Makurdi n'ụbọchị Oktoba iri abụọ na isii. Ndị fada a ga-amalite ịlụ nwanyị? Ndị ụkọchukwu ụka Katọlik Ndị Bishop ụka Katọlik na mpaghara a kpọrọ Amazon ekwekọrịtala ka a na-echi ụfọdụ ụmụnwoke lugoro nwaanyị ụkọchukwu. Ha nwere nkwekọrịta a oge ha nwechara ọgba na Vatican. Pope Francis a ga-ekwe ka ndị 'Fada' bido lụwa nwaanyị? 'Enugwu Katọlik Diocese enwetala bishọpụ ọhụrụ A ga-eme nyocha DNA iji mata ndị ụkọchukwu Katọlik mụụrụ nwa Iwu ụka Katọlik kwuru na ndị ụkọchukwu agaghị alụ nwaanyị. Mana oteela ndị mmadụ na-ekwu ka e lebaa iwu ahụ anya. Tụmadị n'ebe ụfọdụ ndị ụkọchukwu kọrọ ụkọ. Pope Francis Mpaghara Amazon gụnyere akụkụ ụfọdụ na mba Brazil, Peru, Chile, Bolivia Ecuador Venezuela na ndị ọzọ. Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis ebinyebeghị aka na nkwekọrịta a. Akwụkwọ visa ọhụrụ Onyeisi ndị 'Immigration' Mohammed Babandede na-egbuchapụrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mbata na ọpụpụ ndị mmadụ na Naịjirịa bụ Immigration service na-atule iwepụta ụdị akwụkwọ visa atọ ọzọ. Onyeisi ngalaba a bụ Mohammed Babandede kwuru na visa atọ ọhụrụ a ga-eme ka ọdịwanye mfe ndị mmadụ ịbata Naịjirịa. Babandede kọwara na vịsa ndị a gụnyere nke ndị na-abịa njem nlere anya (tourist), nke ndị na-abịa ịchụ nta ego (investors), na nke ndị na-abịa ezumike nka. Nnwereonwe Catalonia Ndị ntọrọbịa na-eme ngaghariwe n'ihu ụlọọrụ ndi uweojii dị na Barcelona ụbọchị satọde Ihe ruru mmadu puku narị atọ n'ụma emeela ngaghariwe na Barcelona maka mkpọchị n'ụlọ mkpọrọ onye ndu ndị Catalonia dị na Spain na-achọ nwereonwe ruo ugbua. A haziri ya bụ ngaghariwe iji wee kwado ọchịchọ nwereonwe obodo ahụ na-arịọ kamgbe afọ 2008 mba Spain nwechara nsogbu akụ na ụba. Cheta na ụlọikpe dị na Spain nyere iwu ka akpọchie ndị isi Catalonia na-achọ nwereonwe ruru itoolu n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Oktoba rue afọ itoolu maọbụ iri na atọ n'ụlọ mkpọrọ. Ndị ọreụ gbata gbata na-ekwu na ọtụtụ mmadụ emerụọla ahụ kamgbe ngagharịwe a malitere nso nso a. Ebe, Ebe onyeisiala mba Chile bụ Sebastian Pinera achụọla ndị imeụlọ ụlọrụ ya niile ka o wee ghọpụta ndị ọhụrụ ga-enyere aka gboo mkpa kpatara ngaghariwe ndị mba ahụ mere nso nso a. Mgbapụta ụmụakwụkwụọ atọrọ na Kaduna Ndị uweojii nọ na steeti ahụ na-ekwu na ọ bụ kepu kepu amamihe ha nwetere mere ka ha gbapụta ụmụaka ahụ Ka abali atọ gafechara, ndị ntọ ahapụla ụmụakwụkwọ nwaanyị isi nakwa ndị ọrụ abụọ nke ụlọakwụkwọ Engravers dị na Kakau Daji, n'okpuru ọchịchị Chikun dị na Kaduna. Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bụ DSP Yakubu Sabo kwuru na ha gbaputara ụmụ akwụkwọ ahụ n'ezie n'abali satọde. Mana ụfọdụ ndị ntaakụkọ depụtara na, nne na nna ụmụaka ahụ kwụrụ ihe karịrị nde naira iri na atọ maka mgbaputa ha. Onyeisiala etoola ụmụ Naịja Otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa ndị erubeghị afọ iri na asaa pịawara ndi otu Hungary azụ n'abalị Satọdee. Ha ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ wee merie ha na asọmpi nke mmepe iko mba ụwa afọ 2019. N'ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Muhammadu Buhari, ike ụmụaka ahụ kpara tụrụ onyeisiala n'anya. Buhari bunyere ha ụkpa ekele ma gbaa ha ume ka ha jide ka ha ji. Naịjirịa ga-ezute Ecuador n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Oktoba. Nkeji: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onye Igbo bụ Ideego mbụ Afrịka hụru mgbe ụwa ka gba ọtọ Onye bụ Abu Bakr al-Baghdadi? Nweenụ ndidi maka 'border', ihe dị ọkụ ga-ajụ oyi - Osinbajo
[ "Naijiria", "Benue steeti", "Ọgụ ndị na-achịehi", "Otu egwu bọọlụ Naịjirịa" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50205502
Ihe ị ga-eji gbaa mbọ kpuchie azụmaahịa gị maka ọdachi
Onye ọkacha n'okwu ịkpụ akụnaụba a kpọrọ 'Risk Manager' akọwaala mkpa ọ dị mmadụ ikpuchi ngwaahịa ya maka ọdachi.
2019-10-28T14:35:58Z
Insurance in Nigeria: Uru dị n'ikpuchi azụmaahịa gị maka ọdachi
Ndị na-azụ ahịa Igbo tụrụ ilu sị 'Agha a gbara ama ya, a dịghị eri nwa ngwọrọ', nke a bụ ka ọ dị n'ihe banyere ikpuchi akụnaụba (Insurance) mmadụ maka ọdachi. Akụkọ a kọwara uru dị nakwa usoro onye azụmaahịa ọbụla nwereike iji chekwaa ngwaahịa ya maka ọdachi ndị gụnyere ọkụ ọgbụgba, mmiri oriri maọbụ izu ya n'ohi. 'Tanka nsi bụ ihe menyụrụ ọkụ n'Onitsha' Ọkụ agbagbuola mmadụ atọ na Nnewi Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ngwaahịa ndị mmadụ lara n'iyi n'ọkụ gbara n'ahịa Ọchanja, Ọnịcha n'izuụka gara aga. Otu onye ọkacha n'okwu banyere ikpuchi akụnaụba bụ Golden Akukwe, kọwara uru ndị a ma nye ntuziaka etu e si eme nke a. Ọ sị na uru gbara ọkpụrụkpụ dị na mmadụ ikpuchi azụmaahịa ya bụ na ụlọorụ na-ahụ maka nke a (insurance company) ga-akwụghachị ya ụgwọ ngwaahịa ndị ahụ ma ọ bụrụ na ihe mee ha. O nyere ndị na-achụntaego ndụmọdụ ka ha gbalịa kpuchie ngwaahịa ha maka 'ihe Ọnịcha gwara Obosi'. Akukwe sị na ọ hụbeghi ọghọm dị na mmadụ ikpuchi ngwaahịa ya ma ọ bụrụ na onye ahụ mere ya n'ụzọ ziri ezi. Kedụ usoro mmadụ ga-eji kpuchie azụmaahịa ya? Golden Akukwe onye ọkacha n'okwu ikpuchi akụnaụba (Risk Manager) Akukwe kọwara ụzọ onye azụmaahịa nwereike iji kpuchie ngwaahịa ya maka ọdachi. Ọ sị na onye ahụ ga-eme ihe ndị a; Ọ ga-agba mbọ hụ na ngwaahịa ya tozuru oke maka ịnata mkpuchi n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka mkpuchi akụnaụba (Insurance Company). Gaa kpọtụrụ ndị ụlọọrụ na-ahụ maka mkpuchi, kọwaara ha ụdị nke ị chọrọ. Ha ga-abịa n'ụlọahịa onye ahụ ma mee nyocha ịmata ego ole ngwaahịa gị niile pụtara. Ụlọọrụ ahụ na onye ahụ ga-etinye aka n'akwụkwọ nkwekọrịta iji kwado mkpuchi ngwaahịa ndị a. Site mgbe ahụ gawa n'ihu, ụlọọrụ a ga-akwụ ụgwọ ngwaahịa ahụ ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọbụla mere ngwaahịa onye ahụ. Akụkọ ndị ga-amasị gị: Imo State na ihe akụ ọnatarachi jupụtara n'ime ya Ọgọdọ ụmụnwaanyị sụụ wụchie n'AMAA 2019 Nna Odumegwu Ojukwu kpara akụ eriwe agwụ agwụ Ihe nkiri ga-amasị gị:
[ "Ịji ego achụ ego", "Naijiria", "Uchu n'ọrụ", "Stọk maketi", "West Africa", "Afịrịka" ]
https://www.bbc.com/igbo/afirika-50215271
Njem ole ka Buhari merela kemgbe May 29?
Njem onyeisiala zọpụrụ gawa mba Saudi Arebia na-ebute ọtụtụ okwu.
2019-10-29T04:38:26Z
Muhammadu Buhari: O mekarịala njem kamgbe ọ ṅụrụ iyi ọrụ n'ọnwa May?
Onyeisiala Muhammadu Buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-esi mba Saudi Arebia ebe ọ gara maka nzukọ gbasara ọdịniihu achụmnta ego zọpụ ije garuo London ebe ọ ga-anọ njem ezumiike site n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba ruo ụbọchị iri na asaa. Njem a kpalitere okwu nke mere ka ụmụ Naijirịa jụwa maka ụgboro ole ọ nọrọla na mba ọzo na-abụghi Naijirịa. Buhari's South Africa Visit: Ndị Ipob sị na ndị uweojii wakporo ha Buhari ga-awụchi na Saụt Afrịka ịma ka eke si anya anwụ Ipob emeghi 'pịm' ka Buhari wuchiri Japan BBC mere nchịkọta ugboro ole na ole onyeisiala garala njem n'ofesi kamgbe ọ ṅụrụ iyiọrụ n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee 2019. Ebe ndị ọ gara na abalị ole ọ nọrọ Saudi Arebia Ọ gara Saudi Arebia ka chi ụbọchị e duru ya iyi ọrụ fochara, nke bụ ụbọchị 30 nke ọnwa Mee. Niger Onyeisiala Muhammadu Buhari gara mba Nijee maka nzụko "African Union". Ọ hapụrụ Naijirịa n'ụbọchị asaa nke ọnwa Julaị ma lọta n'ụbọchị asatọ. Ọ nọrọ otu abalị - Otu (1) Japan Onyeisiala Buhari gara mba Japan maka nzukọ ịkwalite akụnaụba mba ndị dị n'Afrịka. Ọ hapụrụ n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Ọgọstụ. Buhari lọtara n'ụbọchị iri atọ na otu nke Ọgọstụ. Ọ nọrọ abalị - Asaa (7) Burkina Faso Buhari hapụrụ Naịjiria gawa mba Bọkịna Faso n'ụbọchị iri na atọ nke Sepụtemba ma lọta n'ụbọchị iri na ise. Ọ nọrọ abalị - Atọ (3) New York Buhari hapụrụ Naịjirịa gawa mba Amerịka n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Sepụtemba maka nzụkọ 'United Nations General Assembly' (UNGA) na New York Ọ lọtara n'ụbọchi iri abụọ na asatọ. Ọ nọro abalị - Asaa (7) Saụt Afrịka Njem Buhari mere na mba Saụt Afrịka bidoro n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba ma lọta n'ụbọchị anọ nke Ọktoba. Buhari lọtara n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọktoba. Ọ nọrọ abalị - Atọ (3) Rọshịa Buhari gakwara mba Rọshịa n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba. Ọ lọtara n'ụbọchị iri abụọ na ise. Ọ nọrọ abalị - Ise (5) Abalị ole ka Onyeisiala Buhari nọrọla n'ofesi Onyeisiala Buhari anọola ihe ruru ụbọchị iri abụo na otu, nke pụtara izuụka atọ kamgbe ọ ṅụrụ iyi ọrụ n'ọnwa Mee 2019. Akụkọ Ga-Amasị Gị Imo State na ihe akụ ọnatarachi juputara n'ime ya Allen Onyema emekwaala ihe nyịrị mmụọ na mmadụ European Union agbatịala okwu Brexit ruo ọnwa Jenụwarị 2020 Ihe ị ga-eji gbaa mbọ kpuchie azụmaahịa gị maka ọdachi Ihe Nkiri Ga-Amasị Gị
[ "Rọshia", "Naijiria", "Japan", "Amerika", "South Africa", "Burkina Faso", "Niger" ]