sentences
stringlengths
17
659
Ọtụtụ mmadu na-ebo Ibrahim Idris na ndi uwe ojii na ha enweghị ike ị kwusị ọgbaghara na Naijiria
Ha sị na Idris enweghị ike ibelata ogbugbu ndị mmadụ na mpụ ndị ọzọ na-ari elu na Naịjirịa ugbua.
Ha kwukwara ka onyeisi ala tinye onye uwe ojii ọzọ ga-arụ ọrụ dịka o kwesịrị.
Mkpebi a ndị omeiwu mere sotere oku Nuhu Damburam bụ onye otu APC na-anọchite Kano, kpọrọ maka mkpa ọ dị ilebanya na mkpamkpa ndị agboro ndọrọndọrọ na-akpazi na Kano steeti.
O boro ebubo na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa anaghị eme ihe ọbụla doro anya maka ọgbaghara jupụtara na'Naijiria ya.
Cheta na izu ole na ole gara aga, Sineeti kpọrọ Ibrahim Idris oku ka ọ bia kọwara ha ihe mere ọ nwụchibeghị ndị na-achị ahụ wakporo Steeti Benue ma gbuo mmadụ iri asaa na atọ.
Ụlọụka St Philip Catholic Church Ozobulu
Ndị ji egbe gara ụka na St Philip Catholic Church, Ozobulu gbagbu mmadụ iri na atọ biara ụka n' ọnwa Ọgọstụ afọ 2017
Chukwujekwu Eze kwuru n'ụlọikpe ukwu dị na Nnewi, Anambara Steeti na a kpọrọ ya n'ọrụ imemila otu nwoke bụ Aloysius Ikegwuonwu nke ama ama dịka, 'Bishọp' mana ya ekweghị n'ihi na ya achọghị inweta ego site n'ịkwafu ọbara.
Ndị ji egbe gbagburu mmadụ iri na atọ ndị biara ụka na, St Philip Catholic Church, Ozobulu n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2017.
"Anyị chọrọ udo na ikpe zuru oke"
Chukwujekwu Eze kwuru sị: "O nwere otu nwa nwoke aha ya bụ Okpanda onye gwara m na ha chọrọ ịga be 'Bishop' n'Ozubulu ga rụọ ọrụ.
"A jụrụ m ya ụdị ọrọ ọ bụ, ya agwa m na Bishop ji ndị mmadụ ụgwọ na Saụt-Afrịka, na ha chọrọ ịga be ya gbagbuo ihe niile dị ndụ.
"A jụrụ m ya onye zigara ha, ya asị na ọ bụ Obrocho. Mgbe m kwulitere ya, Okpanda, kwuru na ọ ga-enyere m aka ma ọ bụrụ na m soro gaa ọrụ n'ụlọ Bishọp. Agwara m ya na achọghị m ịkwọ aka ọbara."
Eze gara n'ihu kwuo na ọ bụ mgbe ọ gara ịza oku Okpanda kpọrọ ya n'ụlọ ya ụbọchị so ụbọchị ahụ ka ọ hụrụ Dobby (Onyemaechi Mbanefo), otu na ndị eboro ebubo na ha kpara mkpamkpa ahụ, ha abụọ ndị gbara mbọ rịọ ya ka o soro gaa ije ahụ mana o kweghị.
Ndị e boro ebubo na ọ bụ ha kpara nkata ghọrọ ngịga n'okwu mkpamkpa ahụ mere bụ: Onyebuchi Mbanefo, 46, Chukwudi Ugwu, 30 na Great Chinedu Akpunonu, 44.
E jidebeghị ndị ọzọ e kwuru na ha soro mee mpụ a.
Aruziwela ahịa Timbershade gbara ọkụ
Uru ọmụgwọ bara n'omenala Igbo
Egbuola ndịagha Naịjirịa abụọ na Plateau
Achụpụla Jose Mourinho bụ onye nchịkọta Manchester United n'ọgbọ egwuregwu ihe ruru ugboro asaa kemgbe o ji bịa ọrụ na England
Onye nchịkọta otu Manchester United bụ Jose Mourinho ekwuola na o kwesịrị inweta ihe nrite maka na akparamagwa ya agbanweela.
Okwuru sị na o sitere n'ịbụ onye a na-amakarị ikpe ma chụpụ n'akụkụ ọgbọ egwuregwu, bụrụzịa onye a na-anaghị achụpụ (ikpeazụ achụpụrụ ya bụ Septemba 23 nke 2017).
Mourinho kwuru sị na ọbụzị otu n'ime ndị nchịkọta na-akpa agwa ọfụma n'ime Premier League.
"E kpebiela m na m ga-agba mbọ inweta ihe nrite a na-enye onye nchịkọta kacha kpaa agwa ọfụma n'ọgbọ egwuregwu,
"A naghị m egwu egwu - akwadoro m onwe m, obi dị m ụtọ nke ukwuu. Atọhapụchabeghi m onwe m n'iwe oke iwe, ịchịkwa onwe m, n'ime otu egwuregwu. Ezuchaghị m oke.
"Enwere ihe nrite buru ibu - onye kacha mee ọfụma n'izu, onye nchịkọta nke ọnwa, nke a na nke ọzọ - ha were otu nye onye kacha kpaa agwa ọfụma n'ọgbọ egwuregwu.
Ha mekwaa ka ọ bụrụ refrii nke anọ ga-ebinyeaka. Obi kara m na aga m emeri."
Ozị na-eru BBC nti ugbua na-ekwu na ụgbọelụ ndị Russia e jị ebu ndị njem adaruola ala ihe dị ka kilomita iri asatọ ọ hapụchara Moscow.
Ụgbọelu a bụ nke ndị Saratov anụ bụ An - 148 safuru n'ikuku ka ọ nọ n'ụzọ obodo a na-akpọ Orsk.
Akọkụ ndị Interfax kwụrụ n'ụgbọelụ a kuririakuri n'obodo Argunovo nke bụ na onweghị onye a na-atuanya ịpụta na ya.
Mmadụ isii ndị na-elekọta ya bụ ụgbọelụ anya so n'ime ya.
Anyi ka ga ewetara ụnụ ozi maka ihe ma anyi nweta ya.
Neymar siri otu bọọlụ Barcelona gawa PSG
Neymar siri otu bọọlụ Barcelona gawa PSG
Dịka a na-akwado igba asọmpi Eufa Champions nke agba iri na isii n'ime izuka a, ebe ndị Real Madrid ga-ezute ndị Paris Saint-Germain.
Onye na-agbara Madrid bọọlụ bụ Dani Carvajal kwuru na onweghi "ọgwụ" nwereike igbochi Neymar, dịka ọ na-atụ anya ka Neymar laa ezụmike n'otu ụbọchị.
Neymar dịka ihe iyi egwu nye ndị Madrid dịka ha na-aga izuta ndị PSG n'asọmpi ụkwụ nke mbụ.
Carvajal, onye na-agaghị agba bọọlụ nke mbụ a si; "Mgbe gị na Neymar na-amaka bọọlụ, o nweghi ụdị ọgwụ ọbụla pụrụ igbochi ya emela nke ọma."
Ọ sikwa ka ndị Madrid "Nwe olileanya ka ọ [Neymar] ghara ị nọ n'ụbọchị ọma ya"
O kwuru na amabeghi onye ga-eme nke ọma n'asọmpi ahụ ga-adị n'etiti ndị otu abụọ ndị a.
Maiduguri dịna Naịjirịa bụ ebe agha kacha adaụda
Maiduguri dịna Naịjirịa bụ ebe agha a kacha adaụda
Onyeisiala Nịajirịa bụ Mohammadu Buhari ekwuola oge niile na emerịela ndị otu Boko Haram mana nyocha BBC mere n'egosi ihe dị iche
Nyocha ndị BBC Monitoring gosiri na otu ahụ egbuola ndị mmadụ karịrị narị itoolu n'afọ 2017 karịa ndị ha gburu n'afọ 2016.
Ha mere nwakpo n'esepughi aka n'ime afọ nke megidere ihe Buhari kwuru na asụpụla ha.
Anyị achịkọtala ọnụọgụgụ ndịa n'ime mapụ nke na-egosi ụdị nwakpo Boko Haram na-eme, ebe ndị ha wakporo na ọnwa nke kachasị njọ
Kedu ndị bụ Boko Haram?
Boko Haram malitere ibuso Gọọmenti Naịjirịa agha n'afọ 2009 n'ebum n'obi ihiwe Islamic Caliphate na mpaghara ọdịda anyanwụ Afịrịka.
Olekwasịrị anya na mpaghara ọwụwaanynwụ-ugwu nke Naịjirịa ebe ọgbaghara a gburula mmadụ puku narị abụọ, chụpụkwa ndị ruru nde abụọ n'ụlọ ha
Maiduguri dịna Naịjirịa bụ ebe agha a kacha adaụda
Boko Haram nke onyeisi ya bụ Abubakar Shekau kpọrọisi ala nye otu Islamic State (IS) na Maachị 2015
Boko Haram kewara n'ime otu dị icheiche n'ọgọsụtụ 2016 mgbe IS kwuru na ewepụla Shekau dịka onyeisi
Onye ntaakụkọ lekwasịrị anya na Naịjirịa bụ Andrew Walker gwara ndị BBC Monitoring na ọdịghị mfe ịgbakọ wakpo niile ha nwere maka ụdị ntaakụkọ ọdịnaala nke Naịjirịa
BBC Monitoring nyochara akụkọ ndị ntaakụkọ ọdịnaala na nke ndị mba ndị ọzọ wepụtara maka nwakpo emere n'afọ 2016 na 2017 nke nyere nkọwa ụdị na ebe ndị Boko Haram wakporo
Ọnụọgụgụnwakpo na-arị elu n'ọtu ebe
Akụkọ kwuru na Boko Haram mere nwakpo dị otu narị na iri ise n'afọ 2017, nke karịrị ndị ha meburu n'afọ ndị gara-aga dị otu narị na iri abụọ na asaa
Ebe ha mere nwakpo karịsịa n'ọnwa Jenụwarị, nke megidere ihe onyeisiala Buhari kwuru na ha nwụọla
Ndị otu a na-awakpo otu ebe kamgbe afọ abụọ gara-aga.
Naịjirịa bụ ebe akacha wakpo n'afọ 2016 na 2017 dịka Borno Steeti bụ ebe nwakpo a bidoro. Mba Nijee nwetara nwakpo kachasị obere
Ha wakporo mba ndị ọzọ dịka kameruun, Chadị na Nijee n'afọ 2017
Akụkọ kwuru na Boko Haram jịrị ngwaagha mee nwakpo iri itoolu, ebe ha jịrị ogbunigwe mgbagbuonwe wakpo ugboro iri ise na itoolu n'afọ 2017
Ebe nwakpo ha na mpaghara Kameruun na Chadị karịrị na ndị ha jiri nwaagha mee n'afọ 2016.
N'ime ozi a, Naịjirịa nwetara nwakpo ejiri ogbunigwe mee dị iri na itoolu n'afọ 2016 na nke dị iri atọ na asatọ n'afọ 2017, ebe Kameruun nwetara ihe yiwere ya n'ọnụ ọgụgụ
ogbunigwe mbagbu onwe karịrị na mpaghara Maiduguri nke Naịjirịa.
Ọnụ ọgụgụ ndị egburu na-arị elu
Ndị Boko Haram gburu ihe karịrị mmadụ narị itoolu na iri isii na asaa n'afọ 2017, nke karịrị mmadụ narị itoolu na iri n'afọ 2016.
Ebe akacha gbue ndị mmadụ na Maiduguri n'afọ 2017 dịka ndị mmadụ agbala ọsọ ndụ
Ebe ndị ọzọ egburu ndị mmadụ bụ n'ime obodo Magumeri, Konduga, Damaturu na Mubi
Ọtụtụ ndị mmadụ Boko Haram gburu n'afọ 2016 na 2017 bụ ndị bi n'ime obodo n'akwa ndị agha
Ndị Boko Haram na-aga n'ịhụ n'ịwakpo ụlọ ndị alakụba n'akwa ndị gbara ọsọ ihe ize ndụ (IDPs)
Ihe jịkọtara Boko Haram na IS
A matabeghị ihe jịkọtara Boko Haram na IS
Nanị nwakpo iri na atọ n'ime nwakpo dị otu narị iri ise na otu bụ ihe ndị IS kwetara n'ọbụ ha mere
Nke a nwere ike ị bụ maka agha ndị agha Sirịa na Ịraakị busoro ndị IS nke mere ha jiri gbafuo n'ebe ha kpọrọ ụlọ ha n'afọ 2017.
Dịka otu ndị Boko Haram siri akpa agwa mere na IS enweghị ike ịkọrọ n'ọbụ mere ụfọdị nwakpo ha na-eme.
Gịnị mere Boko Haram jiri esionwu?
N'ime afọ anọ, ndị mmadụ akatọọla ndị isiagha naịjirịa maka akwadoghi ndị agha nkeoma ibuso ndị Boko Haram agha
Nke a nwere ike igbanwe n'afọ 2018 dịka ndị mba Amerịka ekwetala iresi ndị Naịjirịa Ngwaagha
Tupu oge ahụ eruo, otu a ka na-akpa ike na-iyi ndụ egwu dịka Tomi Oladipo onye ntaakụkọ BBC Afịrịka kwuru.
Ndị agha Naịjirịa na-ahụsi anya n'ibuso ndị Boko Haram agha
"Agbanyeghị okwu ndị Gọọmenti Naịjirịa n'ekwu na ha emeriela Boko Haram, ndị otu a ka na-awakpo na eyi ndụ ndị Naịjirịa bi na mpaghara ọwụwanynwụ ugwu n'akwa mpaghara Chadị" dịka o kwuru
Oladipo kwuru na Boko Haram na-ezoezo nke mere o jiri dị ike n'ibu agha rute ugbua
"N'ime ọtụtụ afọ ike ndịa nwere ịbata n'ime obodo soro ndị mmadụ biri n'akwa izo onwe ha n'ime obodo bụ ihe nyere ha aka n'ịkpa ike dị egwu" Oladipo kwuru.
Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009.
Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009.
Ụlọikpe ukwu nke Naịjira amalitela ikpe ndị Boko Haram ruru otu puku akpọchiri ọtụtụ afọ ikpe nke abụọ n'ụbọchị taa n'ọdọ ndị agha dịna Kaịnji, ebe a na-atụ anya na ha ga-awụcha nụlọikpe ọdịnala.
Ndị ụlọikpe kwuru na a ga-ama ndị a ikpe n'ihu ọha dịka ndị otu na-ahụ maka ugwu ruru mmadụ n'akwa Amnesty International katọrọ ikpe nke mbụ.
Ikpe nke a bụ nke kachasị n'ikpe a na-ama ndị na-eyị ndụ ekwu n'ala Naịjirịa.
Ihe karịrị ndị ọkaịkpe anọ ga-ekpe ndị a ikpe n'ụlọ mkpọrọ ndị agha.
Ihu foto ndị Boko Haram a na-achọ achọ
A kwụsịrị ikpe n'ịme ọnwa anọ gara-aga, iji nye ohere ka ndị nchekwa mee nyocha gbasara ndị Boko Haram. dịka Mịnịstịrị na-ahụ maka ikpe ziriezi kwuru.
N'ọnwa ọktoba 2017 bụ mgbe ikpe a malitere, amara mmadụ iri anọ na ise ikpe ị ga mkpọrọ afọ atọ rue afọ iri atọ na otu, ebe atọhapụrụ ihe karịrị mmadụ narị anọ maka nweghi ihe aka ebe megidere ha.
A na-atụ anya ị ma kwa ọtụtụ ndị otu a ndịọzọ ikpe n'ọge n'abịa abịa. n
Cheta na ndị Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009.
Ndị Boko Haram a nwụchiri n'afọ 2009
Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009.
Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009.
Ụlọikpe ukwu nke Naịjira amalitela ikpe ndị Boko Haram ruru otu puku akpọchiri ọtụtụ afọ ikpe nke abụọ n'ụbọchị taa n'ọdọ ndị agha dịna Kaịnji, ebe a na-atụ anya na ha ga-awụcha nụlọikpe ọdịnala.
Ndị ụlọikpe kwuru na a ga-ama ndị a ikpe n'ihu ọha dịka ndị otu na-ahụ maka ugwu ruru mmadụ n'akwa Amnesty International katọrọ ikpe nke mbụ.