sentences
stringlengths
17
659
Ihe ise nwaanyị ga-eme iji nweta ikpe ziri ezi ma a kwaso ya iko n'ike
O mere nkeaa Biodun Fatoyinbo eboro ebubo ikwaso nwaanyi iko n'ike rịtuchara n'ọkwa ya dịka onyeisi nchuaja 'Common Wealth of Zion Assembly' akpọrọ COZA n'ịchafụ.
Cheta na Biodun Fatoyinbo rituru n'ọkwa dịka onyeisi nchuaja ụlọụka ya taa bụ ụbọchị July nke mbụ.
Fatoyinbo depụtara nkea n'akara instagram ya.
Fatoyinbo kwuru na ọwakpotubeghị nwaanyị na ndụ ya
Nke a na-eme dịka otu akpọrọ #churchtoo nakwa ndị Naịjirịa mere ngagharịwe n'ụlọụka COZA dị na Naịjirịa ụnyahụ iji gwa Fatoyinbo ya rituo n'ọkwa ka ebochara ya ebubo ikwaso nwaanyị iko n'ike.
Onyeisi otu a bụ Bukky Shonibare kwuru na ya na ndị otu ya ga-akwụ n'ahịrị ga n'ụlọọrụ ndị uweojii nakwa ụlọ ebe a na-enweta ikpe kwụ ọtọ.
Biodun Fatoyinbo asaala Busola Dakolo n'ebubo mwakpo n'ike
Cheta na nwunye ọgụ egwu ama ama bụ Timi Dakolo boro ya ebubo na ọ kwasoro ya iko n'ike ,mana Fatoyinbo kwuru na ọ kwasotubeghị onye ọbụla iko na ndụ ya.
Onyeisi 'Common Wealth of Zion Assembly' akpọrọ COZA n'ichafu bụ Biodun Fatoyinbo arịọla ndị otu ya ha tinye mma n'ọbọ gbasara ebubo ikwaso nwaanyi iko n'ike eboro ya.
Ụkọchukwu Fatoyinbo onye pụtara ka akachara ụka taa gwara ndị otu ya ha awakpola onye ọbụla.
Biodun Fatoyinbo asaala Busola Dakolo n'ebubo mwakpo n'ike
Ọkammụta Austin Nwagbara ekwuterela onwe ya nsogbu na Ghana?
Etu ọ dị ugbua akagbụola ọgbakọ "Seven nights of glory" nke ekwesiri ime n'ụbọchị ọnwa nke mbụ na-abịanụ.
Ndị ọrụ nchekwa na-egbochi ndị mmadụ ime ngagharị iwe n'ihu ụlọụka COZA dị n'Abuja maka ebubo eboro ukọchukwu Bidoun Fatoyinbo na o kwasoro Busola Dakolo iko n'ike.
Ọtụtụ mmadụ zukọkwara n'ihu ụlọụka COZA dị na Legos na-emekwa ngagharị iwe.
Ndị ntaakụkọ BBC kwuru na ndị agha, ndị uweojii, ndị ọrụ 'Civil Defence' nakwa ndị nke DSS kwụchiri ụzọ iji gbochie ndị mmadụ ibanye n'ime ụlọụka ahụ dị n'Abụja.
Na Abuja, lee ụfọdụ foto ndị ntaakụkọ anyị setere na COZA
Ihe Timi Dakolo gwara BBC Igbo
Dakolo kwuru na oge ruo, na ọ ga-ekwu okwu ụwa ga-anụ
Timi Dakolo bụ dị Busola na-ebo Fatoyinbo ebubo ikwaso iko n'ike ekweghị agwa BBC Igbo ihe ọbụla .
Anyị gbara mbọ ịjụpụta ya ihe o chere maka etu ụmụ Naịjirịa si buru okwu a n'isi mana ọ gwara anyị na ọkaiwu ya gwara ya ya azala ajụjụ ọnụ ọbụla.
N'ọnụ ya, oge ruo, m ga-ekwu okwu.
Ihe ise nwaanyị ga-eme iji nweta ikpe ziri ezi ma a kwaso ya iko n'ike
Akụkọ ruru anyị nti kwukwara na onwere ndị otu ọzọ biakwara ebe ahụ igosi nkwado ha maka ụkọchukwu Fatoyinbo.
Otu ndị na-akwado ụkọchukwu Fatoyinbo
Ndị mmadụ na-eme ngagharịwe na Mobolaji Bank Anthony dị n'Ikeja.
Ndị ọrụ nchekwa kwụ chim n'ihu ụlọụka ahụ na-enyocha ndị bịara ika ụka.
Ndị ọrụ nchekwa mụ anya ka azụ
Agbanyeghị na ihu igwe adịghị mma, ndị mmadụ nọ na-emekwa ngagharịwe ha.
Dịka ndị mmadụ ka na-eme ngagharịwe a, cheta na onyeisi ụlọụka COZA bụ Biodun Fatoyinbo depụtara n'akara soshal midia ya na ọ kwasotubeghị nwaanyị iko n'ike mbụ.
@queeninghere gosipụtara ebe ndị ọrụ nchekwa na-egbochi ndị na-eme ngagharịwe.
Mana Busola nwunye ọgụ egwu ama ama bụ Timi Dakolo na-ekwusi ike na Fatoyinbo wakporo ya n'ike.
Onyeisi ndị uweojii bụ Adamu Mohammed ezipula ndị otu ya ha ka ha chọpụta ndị wakporo ụlọ rụ ndị uweojii n'obodo Agudama Ekpetima dị na Bayelsa steeti.
Ndị uweojii sị na ndị ojiegbe wakporo ụloọrụ ahụ n'ụtụtụ taa bụ abalị nke mbụ nke ọnwa Jụlaị 2019.
Zamfara: Ndị uweoji anwụchiela mmadụ atọ
Ndị uweojii: Atọọrọla onye mba Jamini na Kano
Mwakpo a, dịka ndị uweojii si kwuo, tara isi otu onye uweojii aha ya bụ Ola Rosanla na ndị uweojii ato ọzọ.
Ha sịkwa na mmadụ abụọ ọzọ merụrụ ahụ.
Maazị Mohammed nyere iwu ka ezipu ndị uweojii si na ngalana nyocha pụrụiche akpọrọ "IGP-Intelligence Response Unit" (IRT) na ndị ọzọ si na ngalaba "Forensic and Homicide" nke FCID nakwa nke uweojii ndi mmiri.
Akụkọ kọrọ na nwaanyị dị ime onye ụweojii so na ndị egburu na ya bụ nwakpo.
Ọtụtụ mmadụ tọrọ atọ na nkpọ (container) bu ha.
Ndị omekaome eche na ha bụ ndị otu nzuzo nọrọ n'ụbọchị Mọnde bụ abalị mbụ nke ọnwa Jụlaị 2019 gbaa ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Obowo dị n'Imo Steeti.
Ndị omekaome a chụsara ndị uweojii ole na ole nọ n'ọrụ ma buru ngwa egbe ruru anọ gbafuo.
Ndị ojiegbeezu awakpoola ebe obibi n'Ọnịcha
Akụkọ kachasị: Aka akparala ndị gburu Ụkọchukwu
A sị na mkpa mkpa a mere mgbe ọ fọrọ nkeji iri ka ọ kụọ elekere atọ nke ehihie n'ụbọchị Mọnde.
Ndị ntaakụkọ Punch sị na ha kpọrọ kọmịshịona ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Rabiu Ladodo o wee kwuo na ọ nọ ebe ahụ ugbua.
O kwuru na ọ ga-ezi ozi dịka ihe si eme mgbe na adịghị anya.
Mana mgbe BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Godson Orlando Ikeokwu, o kwuru na nke a mere mana onwetebeghi akụkọ ya n'uju.
Ụzọ ị ga-esi gbalahụ nsogbu na 'checkpọint'
Ụlọomeiwu ebinyela aka n'akwụkwọ 'police reform bill'
N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bu Frank Mba, Mohammed kwuru na ọnwụ ndị uweoji ahụ agaghi abụ ihe nkiti.
RUGA agaghị enwe isi ebe a
Gọvanọ Ebọnyị Steeti Dave Umahi
Govanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi ekwuola na onweghi steeti ọbụla n'ọwụwa anyanwụ so n'atụmatụ RUGA.
Ọbụghị m na-ahazi atụmatụ Ruga - Osinbajo
Umahi kọwara na ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ nwere ike i na-eresi ndi ọchịehi ahịhịa ha ji azụ ehi ha mana ọbụghị inye ha ala ebe ha-ga abịa biri.
Ụlọikpe agbawala Patience Jonathan aka
Patience Jonathan bụ nwunye onye chibụrụ Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan
Ụlọikpe ukwu dị na steeti Legọs enyela iwu ka gọọmentị Naịjirịa weghara ego niile nke EFCC sị na Patience Jonathan zupuru oge di ya bụ Goodluck Jonathan bụ onyeisiala.
Ọkaikpe Mojisola Olaterogun nyere iwu a taa wee kwuo na Patience enyeghi nkọwa zuru oke etu o si nweta ego ndị ahụ.
Ndị na-eme ngagharị iwe na mba Hong Kong
Ndị na-eme ngagharịiwe na mba Hong Kong abanyela n'ụlọ ndi omeiwu obodo ahụ.
Ha na-egosi iwe ha maka iwu ọhụrụ nke kwuru na e nwere ike ikpụrụ ndị dara iwu obodo ga kpee ha ikpe na china.
Onye nlekọta ndị otu Super Eagles Gernot Rohr na ọgbaa bọọlụ Samuel Chukwueze
Onye nlekọta ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na ndị otu ya ga-ebili n'ura dịka Madagasaka merichara ha n'ụbọchị Sọnde.
Ka ọ dị ugbua, amabeghi ndị Super Eagles ga-ezute na agba nke ọzọ nke AFCON 2019.
Lee ihe ndị Igbo na-eme emume BBNaijia bụbụ tupu ha esonye
Ihe mere ede ji bee nwịị maka COZA
'Nne Leah Shaibu bụ ọnye asi '- Nigerian Embassy
N'ụbọchị 29 nke ọnwa Juun 2019, otu jikọtara mba ọdịda anyanwụ Afrịka bụ Ecowas kwekọrịtara na aha a ga-akpọ ego mmekọrịta mba dị na mpaghara ahụ.
Ecowas - bụ otu nwere mba 15 n'ime ya - sị na aha ego ahụ ga-abụ "Eco".
Nkwekọrịta bịara ka afọ 30 gachara kemgbe amalitere okwu inwe otu ego na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka tinyere ọkụ n'ite atụmatụ a ndị Ecowas na-esi.
Mana, ihe ọtụtụ mmadụ amaghị bụ ihe nwepụta ego ọhụru a ga-apụta n'ahịa nakwa na mmekọrịta obodo mba dị iche iche n'ọdịda anyanwụ Afrịka?
Ọ bụ n'afọ 2020 ka Ecowas sị na a ga-amalite rewe ego 'Eco' a, mana ọ dịghị ka ndị mmadụ ama maka nke a.
Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ya anụbeghị maka ihe a kpọrọ "Single currency".
Nke a pụtara na ọrụ karịrị nke ndị Ecowas ga-arụ maka atụmatụ a.
Mana ọbụghị naanị ime ka ndị mmadụ mata maka ego a dịrị ndị Ecowas.
Ọ bụ n'afọ 1975 ka Ecowas malitere. N'ime mba 15 sonyere n'Ecowas, asatọ - Benin, Burkina Faso, Guniea-Bissau, Ivory Coast, Mali, Niger, Senegal na Togo - na-erikọta ego akpọrọ CFA franc.
Atụmatụ 'Eco' a ga-eme ka mba ndị a kwụsị iri CFA franc.
Ọfọdụ ndị na-akwado atụmatụ a na-ere etu mba ndị a ji na-erikọ CFA france ka etu Eco ga-esi gaa.
Agbanyeghị nke a, onyeisi ndị na-enyocha ihe banyere akụnaụba ọha n'ụlọọrụ PwC West Africa bụ Andrew S. Nevin gwara ụlọ ntaakụkọ France 24 na "Atụmatụ inwekọ ego a erughi erụ, ọkachasị etinye uche na Naịjirịa ebinyegbeghi aka n'atụmatụ nchịkọta ọdịda nnywanwu Afrịka."
Maazị Nevin gakwara n'ihu sị na inwe otu ego abụghị oke mkpa ugbua.
"Ị ga-ebu ụzọ hazie etu esi eme nkwekọrịta ndị ọzọ e nwere banyere azụmaahịa na mpaghara ahụ, ga zie hazie ihe mmepe obodo."
Farida Adamu bụkwa onye ọkammụta n'ihe banyere akụnaụba kwenyere na Afrịka adịbeghi njikere maka ego nwekọrịta.
Adamu sị: "Ya bụrụ na a ga-eme ya, e kwesiri ịhazị etu e si ere ego bụ nke Bekee kpọrọ "Monetary Policy", ọkachasị etu o si metụta mpaghara ndị emepebeghi nke ọma."
Onye otiegwu amaama bụ Nathaniel Bassey etinyele ọnụ n'ihe gbasara okwu nwakpo dị na etiti Busola Dakolo na onyendu COZA bụ Biodun Fatoyinbo.
Ọ mere ihe onyonyo a na-akpọ "instagram Live", ma were ohere ahụ were kwuo obi ya na okwu nwakpo ahụ.
Ihe mere ede ji bee nwịị maka COZA
Agbaala ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Obowo Imo Steeti
Dị ka ọ mechara nkea, ụfọdụ ndị mmadụ na-eto ya ma ebe ụfodụ na-akatọ ihe o kwuru.
Lee ihe ndị mmadu nwere ikwu maka okwu Nathanjiel Bassey n'igwe twitter.
Ekweteghi m n'aro nke anọ, ndị okenye n'elekọta ụka ekwesighị ikpe ikpe gbasara mpụ maka nkea bụ ọrụ ndị gọọmenti kama ha nwere ike ikpe ikpe gbasatara omụme.
Ihea abụghị olileanya m ebe Nathaniel Bassey nọ.
Enweghị ihe di njọ na nchịkọta ihe Nathaniel Bassey kwuru . . . e kwenyere'm, kwesie ike.
Nathaniel Bassey gbuwara ya nke ọma.
Onweghị Alaigbo so na Ruga
Ihe i kwesiri ịma maka atụmatụ 'Ecowas single Currency'
Lee ihe ndị Igbo na-eme emume BBNaijia bụbụ tupu ha esonye