sentences
stringlengths
17
659
Dennerby bụ onye egwuregwu bọọlụ otu Hammarby na Sparvagens na oge gara aga.
O sokwa na otu ndi egwuregwu bọọlụ ụmụ okorobia dị afọ iri abụọ na otu nke Sweden.
Dennerby rụkwara ọrụ ndị uwe ojii. Bụrụkwa onye nkụzi nke otu Allsvenskan na Hammarby na afọ 2001.
Ndị mmadụ akatọọla akụkọ na-apụta maka ụmụ enwe abụọ a rụpụtara n'ụlọ sayensi n'ihi na ha-sị na ọ ga-adị mfe ị rụpụta mmadụ etu aha.
Oteela ndị agha Naịjirịa ji arụ ọrụ nzọputa na North east
Okwu a pụtara mgbe ndi Amnesty International kwuru na ndi agha ugbọ elu ala Nigeria jiri ụgbọ elu nke government wee nyere ndi na-egbu mmadụ bụ fulani herdsmen aka ka ha wakpo ndị obodo.
Ha kwuru na akụkọ ahụ bụ asi.
Ndi agha siri na ọ bụ ihe mwute na ndi amnesty kwuru na ha napụrụ ndi numan na obodo ndị gbara ha gburu gburu ikike diri mmadụ
Onye ihe gbasara ndi agha na ọha na eze di na aka, bu Air Vice Marshal Adetokunbo Adesanya kwuru na ndi agha bụ ndi azụrụ nke ọma, na ha anaghi anapụ onye ọbụla ikike diri ya.
Odoro anya na onweghị mgbe ndi agha jiri kwado otu ndi Ọchụ ehị na ọgụ ahụ were kọwaa ebubo ndi amnesty dika nke na erijughi afọ.
Adesanya kọwara na ubọchi nke anọ december na afọ 2017, a kpọrọ ndị agha ugbọ elu ka ha gbata ọsọ enyemaka maka ọgu na ada na obodo Numan na Adamawa state, mgbe ha rutere ha hụrụ ọtụtụ ndi mmadụ na emebisi ihe, na agba ụlọ ọkụ.
Ọ gwara ọhaneze na onweghi mgbe ndi agha jiri gbaa ụlọ ọkụ, gbuo mmadụ, ma ọbụ kwado ndi na achụ ehị ka ha daa iwu obodo.
Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump emela mgbasa ozi nke mbụ gbasara etu ọchịchị Amerịka si aga kamgbe o were ọchịchị n'afọ 2017.
Trump site na mgbasa ozi ahụ o mere kwuru na ya na-enye ndị otu pati Demokrat ohere ka ha rụkọ ọrụ.
Trump kwukwara na ya chọrọ ka ụlọmkpọrọ a na-akpọ Guantanamo Bay ghere oghe na-eweghachi iwu onye buburu onyeisiala Amerịka bụ Obama nyere ka emechie ya.
Akụnaụba mba Amerịka na-arị elu mana ndị mmadụ anabataghị onyeisiala ha bụ Trump.
Ndị so mee ihe nkiri "Black Panther" goziri omenala Afrịka mgbe ha gara mmeme mbido ya bụ ihe nkiri nke ụlọọrụ Marvel mepụtara.
Ha niile kere ekike mba Afrịka di icheiche maka na ha kwuru sị na ọ dị mkpa igosi Afrịka nke ọma.
Chadwick Boseman bụ onye jere ozi dịka T'Challa, Eze mba Wakanda, bụ onye e ji maka ya mee ihe nkiri "Black Panther", duuru ndị ọzọ nọ n'ihe nkiri a gaa ebe emere mmeme a na Los Angeles.
Ndị dịka Lupita Nyong'o, David Oyelowo, Daniel Kaluuya, Michael B Jordan, Danai Gurira na Angela Bassett kere ekike ndị Afrịka.
N'akwụkwọ eji gwa ndị mmadụ maka mmeme a, e dere sị ha jikere ka "ndị eze Afrịka".
David Oyelowo bụ nwa afọ Naịjirịa na Nwunye bụ Jessica so bịa emume a
Janeshia Adams-Ginyard nọchitere anya Danai Gurari dịka Okoye Dora Milaje na ihe nkiri a
Lupita Nyong'o bụ onye Kenya nweterela ihe nrite ndị na-eme ihe nkiri a na-akpọ Oscar
Chadwick Boseman bụ onye mere ka T'Challa n'ihe nkiri a
Danai Gurira bụ nwa afọ Zimbabwe mere ka Okoye Dora Milaje n'ime ihe nkiri a
Ọ ga-adị mma ka ndị ome ihe nkiri ndị ọzọ na Hollywood bido ije omume ha a?
Ndị akwụna nọ na Benin
Izupu ụmụnwaanyị n'ala Naijirịa na-eweta nwute nye ndị gọọmentị Naijirịa
Ndị ụweojii nọ na Spain anwụchiela mmadụ iri na otu ndị asi na-atụ mgbere akwụna.
Akụkọ kwukwara na ha ji ụfọdụ ụmụ nwaanyị Naijirịa ezupuru n'obodo akpa ego.
Anwụchiri ha na obodo akpọrọ Zaragoza ebe ndị uwe ojii zọpụtara umu nwaanyi iri na isii emere ohu mmetọ ahụ.
E ji ọtụmọkpọ yi ha egwu n'ekwenti.
A manyere ha iwu ikwụ ụgwọ akpakọtara ejị si na Naijirịa zupu ha.
Aghọriri ụmụnwaanyi ndịa n'ikwete na ha ga-ebi ndụ kacha nma na yuropụ
E kwuru na ndị otu a nwere njikọ na Italy,Germany nakwa Denmark.
Onyeisi ala US bụ Donald Trump kwuola na ya nwere 'nnukwu mkwayere ugu nye ndị mba Afrịka
N' akwụkwọ ozi, ngalaba 'US Department' tinyere na websait ha, ha kwuru sị: " Yunaited Steeti na-enwe obi mwute n' iyi ọrụ nke onye ndu ndị na- ama gọọmenti Kenya aka n'ihu bụ Raila Odinga duru onwe ya ka ọnwa Jenuwari gbara ịrị atọ.
"Anyi na-ajụ agwa ọbụla nke megidere Iwu ala Kenya.
"A họpụtara Uhuru Kenyatta dịka onyeisi ala Kenya ka ọnwa Ọctoba afọ 2017 dị iri abụọ na ntuliaka nke ụlọikpe kachasị elu na Kenya kwadoro.
"Onye ọbụla nwere mkpesa ọbụla kwesiri isoro usoro iwu ala debere."
US katọkwara otu gọọmentị Kenya siri mechie ụlọ ntaakụkọ na Kenya si, na ohere onye kwue ka ọ dị ya dị mkpa na ọchịchị onyekwueuche ya, ma rịọ ka ndị ndu na ndị a na-achị na Kenya bido mkparịta ụka maka ịkpa udo na ịdịnaotu.
N' otu aka ahụ, otu EU kwuru na iyi ọrụ Raila Odinga duru onwe ya megidere iwu ma katọkwa mmechi gọọment Uhuru Kenyatta mechiri ụlọ ntaakụkọ atọ.
Cheta na Gọọmenti etiti mechiburu ụlọọrụ ngosi TV atọ maka na ha gbasara ozi gosịrị Raila Odinga ebe ọ na-edu onwe ya iyi ọrụ ma kpọkwa onwe ya onyeisiala mba Kenya, ebe ulọikpe Kenya akwụsịrị mmechi ahụ ụbọchị Wenesde.
kansa akpamamịr na-aka egosi oge ụmụnwọke ruru afọ iri anọ
Ọnụọgụgụ ụmụnwoke na-anwụ site n'ọrịa kansa akpamamịrị akarịala ọnụogụgụ ụmụnwaanyị na-anwụ site n'ọrịa kansa ara dịka nchọpụta siri kwuo na mba UK.
Ụmụnwoke na-aka nka pụtakwara na ọtụtụ ka na-enweta mana anwụ site n'ọrịa ahụ.
Ndị nyocha gbasara ọrịa kansa nọ na mba UK kwuru na nchọpụta na ọgwugwọ a na-eme maka kansa ara na-amịta mkpụrụ ebe itinye ego gbasara kansa akpamamịrị umụnwoke ga-enyekwa aka.
Nchọpụta ọnụọgụgụ pụtara site n'afọ 2015 gosiri na mmadụ 11,819 nwụrụ site na ọrịa kansa akpamamịrị ebe mmadụ 11,442 nwụrụ site na ọrịa kansa ara.
Kansa akpamamịrị kachasị n'ụmụnwoke nọ na UK
Ndị ọrụahụike ekwuola na nchọpụta n'oge kachasị mkpa iji gwọ akpụ kansa.
BBC Igbo gbara Dọkịnta akpọrọ Remi Ajekigbe ajụjụ ọnụ,o kwuru na ọrịa kansa ara ka egbu karịa ọrịa kansa akapamamịrị na Naijirịa.
O kwukwara na ebe nsogbu na dịkari bụ na ụmụnwoke anaghị bia nyocha ahụ n'oge.Ha na bia mgbe ihe ọ ka njọ.
"A na-agagharị na-akuziri ndị mmadụ n'ulọ akwukwọ,chọọchị,ulọakụ na ebe ndị ọzọ maka ọria Kansa nakwa ka esi egbochi ya".
Emume ndị a ka a ga-eji nabata ụbọchị nrụbama ibuso agha ọrịa kansa bụ Februwarị anọ.
Tinubu ebe ọ nọ na ọgbakọ ndị otu ya bụ APC na ntuliaka nke afọ 2015
'Edemede ahụ bụ nke aghụghọ'
Onyeisi otu nọ n'ọkwa ọchịchị nke a na-akpọ, 'APC' bụ Bola Ahmed Tinubu ekwupụtala okwu maka ihe edemede Obasanjo degara Buhari.
Ọ sị na Obasanjo na-egwu 'egwuregwu ndọrọndọrọ' n'edemede ahụ.
Ọ sị na ebe ha abụọ bụ ndịchịrị n'okpuru ndị agha, Obasanjo kwesiri ịkpọ ya n'azụ dọọ ya aka na ntị kama ị gwa ya n'ihu ọha.
O ruola izuụka abụọ Obasanjo degara Buhari edemede ahụ na-asị ya ritue n'ọkwa,ghara ịzọ ọchịchị na afọ 2019.
Ọ sị na ọbụrụ n'obi dị Obsanjọ ocha, o kwesiri ịkpọ onyeisiala Buhari n'akụkụ gbaa ya izu.
O kwuru nke a ebe ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ na Owere (Owerri) ka ọ na-akwado ịga mmemme nkwanye ugwu Alex Ekwụeme.
Onye na-ahụ maka mgbasa ozi onyeisi ala Naijiria bụ Garba Shehu ekwuola na ọ bụ ihe ọjọọ ịkpọ Muhammadu Buhari onye 'ogbuọchụ' maka ọtụtụ mmadụ e gburu na Benue steeti.
Shehu kwuru na ndị Naijiria kwesiri ikwanyere onyeisi ala ugwu maka na Buhari bụ onye na-eche ndu ha niile.
Mana nwere ndị kwe ma ndị ekweghị na mkparịtaụka BBC na-aka ndị okaiwu dị icheche nwere gbasara okwu ahụ.
Femi Falana bụ onye okaiwu gwara BBC Igbo n'elu ekwentị na Buhari bụ onye megburu onwe ya.
"Aka o ji achị Naijiria esighị ike chacha. Ihe a butere n'oge o kwesịrị ibilite ịhụ maka nkwụsị ogbugbu mmadụ na Benue, onweghị ihe o mere."
"Ọ dị zị ka Buhari amaghị ihe na-eme n'obodo anyị. Ọ maghị na ihe emebiala. Ke kọ sị bụ na ndị a na-egbu mmadụ na Benue, mana onweghị onye ọbula ndị a jidere?"
Mgbe BBC jụrụ Falana ma o chere na dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na onyeisi ala asọchitere ndị na-achị ehi nke butere nsogbu ahụ jiri aga n'ihu.
Falana kwuru na "Ebubo nke a enweghị isi! Chete n'oge ọchịchị onyeisi ala oge gara aga bụ Goodluck Jonathan, n' etiti afọ 2012 na 2016, e gburu mmadụ karịrị puku abụọ. N'oge Obasanjọ, e gburu mmadụ karịrị puku ịrị abụọ n'ime ọgụ dị ichiche."
Falana kwukwara na "Ihe a na-eme n'ala Naijirịa bụ nsogbu obodo dara ada. Ọ bụghị maka ọchịchị Buhari."
Mana onye okaiwu bụ Lanre Lasisi ekwetaghị n'okwu Falana kwuru.
N'okwu ọnụ ya, "Ke ka o si bụrụ na oge ọbụla ndị na-achị ehi gburu mmadu, onweghi onye a na-ejidere? Mana ugbua mgbe ha gburu ndị Fulani na Gboko, ndị uweojii e jidela ndị e chere na ha mere ihe ọjọọ nke a?"
Maka nkatọ a na-akatọ Buhari, Lasisi gwara BBC na ndị Naijiria enwerela Buhari ndidi ebe ọ dị ukwu, na nsogbu dị ekwezịghị ha edi.
N'okwu ya, onye ọkaiwu ọzọ bụ Chukwuemeka Eze rịọrọ ndị Naijiria ka ha nwere Buhari ndidi.
Eze kwuru na "Ọ dịzị n'aka ndị uwe oji na ndị agha ị kwụsị ihe ọjọọ gbasara ogbugbu mmadụ na eleghị anya ma ọbụ onye Fulani ma ọ bụ onye agbụrụ ndị ọzọ."
Lafia Dole bụ aha agha ebidoro ibuso Boko Haram kamgbe afọ 2015.
Onye bụ nwunye dibia na-ahụ maka ahụike onyeisi otu Boko Haram bụ Rabi Abu-Yasir chiliri ndị agha Naịjirịa aka elu ụbọchị Satodee abalị atọ nke ọnwa Febuwarị dịka ha naebu agha a na-akpọ Lafia Dole.
Onye nchịkwa agha Lafia Dole bụ Major General Rogers Nicholas kwupụtara nke a oge o nyefere ụmụnwaanyị na ụmụaka dị mmadụ iri asatọ na abụọ ha gbapụtara n'aka ndị Boko Haram ma nyefee ha n'aka ndị ọrụ nchekwa na Borno steti.
Rabi gwara ndị ntaakụkọ na di ya bụ dibia na-elebanye anya n'ahụike onyeisi Boko Haram bụ Abubakar Shekau.
O kwuru na a gbapụtara ya ụbọchị Fraide dịka ndị agha Naịjirịa chụpụrụ ndị Boko Haram nọ nime ọhịa Sambisa.
Dịka ọ na-ekwupụta ka ya na ihe si gaa, Rabi kwuru na ọ masịrị ya etu esi na eledo ya anya maka ọkwa ọ nọ dịka nwunye dibia Shekau.
N'okwu ya, "Dị m, abu-Yasirbụ dibia Shekau, ọ na-eledokwa ndị ọzọ ahụ na-adịghị ma na-emekwa iwe ahụ."
Etu esi eme m Rabi dịka nwunye dibia Shekau
"Ụdị nri m na-eri dị iche n'ihe a na-enye ụmụnwaanyị na ụmụaka ndị ọzọ nọ n'ogige ahụ."
Anyị tara ahụhụ n'aka ha, ha dọkwara anyị aka na ntị na ndị agha Naịjirịa ga-egbu onye ọbụla nyefere onwe ya n'aka ha."
Ana chosi Shekau ike na Naịjirịa ugbua.
"Ha gwara anyị oge ọbụla ka anyị nọnyere ha ma rube isi nye ndị otu ha, mana ndị agha Naịjirịa na-eledo anyị anya na-abụghị ihe ndị Boko Haram gwara nyị."
Rabi toro ndị agha Naịjirịa maka mgbapụta agbapụtara ha ebe ọ kpọkuru ndị a tọrọatọ bụ ndịka nọ nime ọhịa ka ha pụta bịa nyefee onwe ha n'aka ndị agha.
Nichola bụ onye nchịkọta agha Lafia Dole kọwara na Rabi sọ na mmadụ iri asatọ na anọ ndị agha gbapụtara.
O kwuru na mmadụ asatọ nime mmadụ iri asatọ na anọ ahụ agbapụtara na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ndị agha elu Naịjirịa.
Onye nchịkota ahụ kwuru na ndị ahụ a tọrọ na-agabiga ntaramahụhụ di egwu n'aka ndị Boko Haram.
Nicholas mere ka a mata na a gbapụtara ndị ahụ site n'aka ndị Boko Haram,chụpụb ha ma nọchie isioche Shekau dị n'ọhịa Sambisa.
Rochas Okorocha wepụtara ụlọọrụ na ahụ maka aṅụri nke nwanne ya nwaanyị bụ onye ndu.
Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha eweliela iwu ahụ o tinyere maka ndị ọrụ bekee ịbia ọrụ abalị atọ n'izuụka.
Okorocha kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ zukọrọ ka ọ na-akwado ime mmemme o ji echeta na ụmụ akwụkwọ n'Imo steeti anọọla afọ asaa ma akwụghị ụgwọ akwụkwọ.
Rochas machiri ịkwụ ụgwọ akwụkwọ n'Imo steetị mgbe ọ banyere n'ọchịchị.
Ọsị na ndị ọrụ ga-amalite ịga ọrụ ụbọchị ise n'ime otu izu site n'ụbọchị mbụ n'ọnwa Machị maka na ọtanisi nke jibu obodo Naịjirịa ebeela.