English
stringlengths
0
7.15k
Igbo
stringlengths
0
11.1k
David asked Hushai to go back to Jerusalem and pretend to be Absalom’s friend so that he could convince Absalom to listen to his advice instead of Ahithophel’s .
Devid gwara Hushaị ka ọ laghachi Jeruselem , mee ka ọ̀ bụ enyi Absalọm ka o nwee ike ime ka Absalọm kweta ime ihe o kwuru kama ime ihe Ahitofel kwuru .
Hushai was courageous and risked his life to obey David and to stay loyal to Jehovah .
Hushaị nwere obi ike , rubere Devid isi ma kwado Jehova n’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ya .
David prayed that Jehovah would help Hushai , and that is what happened .
Devid rịọrọ Jehova ka o nyere Hushaị aka . Jehova mere otú ahụ .
Absalom listened to Hushai instead of Ahithophel . ​ — 2 Samuel 15 : 31 ; 17 : 14 .
Absalọm gere Hushaị ntị kama ige Ahitofel ntị . — 2 Samuel 15 : 31 ; 17 : 14 .
Why do we need courage to be loyal ?
Gịnị mere anyị ji kwesị inwe obi ike ka anyị nwee ike ịna - akwado Jehova ?
We need courage to be loyal to Jehovah and obey him instead of doing what our family members , workmates , or government authorities want us to do .
Anyị kwesịrị inwe obi ike ka anyị nwee ike ịna - akwado Jehova ma na - erubere ya isi kama ime ihe ndị ezinụlọ anyị , ndị ọrụ ibe anyị , ma ọ bụ ndị ọchịchị chọrọ ka anyị mee .
For example , ever since he was a little boy , Taro , in Japan , did all he could to make his parents happy .
Dị ka ihe atụ , e nwere otu nwanna bí na Japan aha ya bụ Taro . Malite mgbe ọ bụ nwata , ọ na - eme ihe niile o nwere ike ime ka obi dị́ nne ya na nna ya ụtọ .
He obeyed them and was loyal to them , not just because he had to , but because he loved them .
Ọ na - erubere ha isi , na - akwadokwa ha , ọ bụghị iji mezuo iwu , kama n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya .
But when he started to study with Jehovah’s Witnesses , his parents wanted him to stop .
Ma , mgbe ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl , nne ya na nna ya chọrọ ka ọ kwụsị .
This made him sad , and it was very difficult for him to tell them that he had decided to go to the meetings .
O wutere ya , ịgwa ha na ya ekpebiela ịna - aga ọmụmụ ihe sikwaara ya ike .
Taro says : “ They were so angry that for years , I was forbidden to visit them at home .
Ọ sịrị : “ Otú iwe si wee ha mere na ruo ọtụtụ afọ , ha ekweghị ka m lọta ụlọ hụ ha .
I prayed for courage to stick to my decision .
M kpere ekpere ka Jehova nye m obi ike ime ihe m kpebiri .
Now their attitude has softened , and I can visit them regularly . ” ​ — Read Proverbs 29 : 25 .
Iwe ha adajụọla ugbu a . M na - agazi ahụ ha mgbe niile . ” — Gụọ Ilu 29 : 25 .
How have you benefited from this study ?
Olee uru i ritere n’isiokwu a anyị mụrụ ?
Like David , Jonathan , Nathan , and Hushai , may we too feel the satisfaction that comes from being loyal to Jehovah .
Ka anyị na - akwado Jehova otú Devid , Jọnatan , Netan , na Hushaị mere . Anyị mee otú ahụ , anyị ga - enwe obi ụtọ .
We never want to be like Abner and Absalom , who were not loyal .
Anyị achọghị ime ka Abna na Absalọm , bụ́ ndị na - akwadoghị Jehova .
It is true that we are imperfect and make mistakes .
N’eziokwu , anyị bụ ndị na - ezughị okè , anyị na - emejọkwa .
But let us show Jehovah that being loyal to him is the most important thing in our lives .
Ma , ka anyị na - egosi na ihe kacha anyị mkpa bụ ịkwado Jehova .
[ 1 ] ( paragraph 7 ) Some names have been changed .
[ 1 ] ( paragraf nke 7 ) Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha .
If we are loyal and humble , we will not focus on what we want but on what Jehovah wants us to do
Ọ bụrụ na anyị na - akwado Jehova ma dị́ umeala n’obi , ihe ga - adị anyị mkpa abụghị ime ihe anyị chọrọ , kama ọ bụ ime ihe Jehova chọrọ ka anyị mee
If we are loyal and kind , we will try to help others , and we will treat them the way Jehovah wants us to
Ọ bụrụ na anyị na - akwado Jehova ma dị́ obiọma , anyị ga na - agbalị inyere ndị ọzọ aka , anyị ga na - emesokwa ha otú Jehova chọrọ ka anyị si na - emeso ha
If we are loyal and courageous , we will obey Jehovah even when it is difficult or when we feel afraid
Ọ bụrụ na anyị na - akwado Jehova ma nwee obi ike , anyị ga - erubere Jehova isi , ọ bụrụgodị na o siiri anyị ike ma ọ bụ na ụjọ na - atụ anyị