English
stringlengths
0
7.15k
Igbo
stringlengths
0
11.1k
It is clear that even though David made serious mistakes in his life , he never stopped being loyal to God .
O doro anya na n’agbanyeghị na Devid mere ihe ndị jọgburu onwe ha , o nweghị mgbe ọ kwụsịrị ịkwado Chineke .
In this article , we will discuss the example of David and others who lived at that time and learn how we can be loyal to Jehovah more than to anyone else .
N’isiokwu a , anyị ga - eleba anya n’ihe Devid na ndị ọzọ bí n’oge ya mere , mụtakwa otú anyị ga - esi na - akwado Jehova karịa onye ọ bụla ọzọ .
And we will discuss other qualities that will help us to do so .
Anyị ga - atụlekwa àgwà ndị ọzọ ga - enyere anyị aka ime otú ahụ .
What lesson do we learn from Abishai’s mistake ?
Gịnị ka ihe Abishaị mejọrọ na - akụziri anyị ?
When Abishai wanted to kill Saul , he was trying to be loyal to David .
Ihe mere Abishaị ji chọọ igbu Sọl bụ na ọ chọrọ ịkwado Devid .
But because David knew that it would be wrong to harm “ the anointed of Jehovah , ” he did not let Abishai kill the king .
Ma ebe Devid ma na ọ dịghị mma imerụ “ onye Jehova tere mmanụ ” ahụ́ , o kweghị ka Abishaị gbuo Sọl .
This teaches us an important lesson : When we need to decide whom to be loyal to first , we need to think about which Bible principles can help us in our situation .
Ihe dị́ mkpa anyị na - amụta n’ihe a bụ na ányị chọọ ịmata onye anyị ga - akwado karịa onye ọ bụla ọzọ , anyị kwesịrị iche echiche mata ihe Baịbụl kwuru nke ga - enyere anyị aka .
It is more important to be loyal to Jehovah than to anyone else
Anyị kwesịrị ịkwado Jehova karịa onye ọ bụla ọzọ
Although it is natural to be loyal to our family and friends , why must we be careful ?
N’agbanyeghị na obi na - adị anyị ụtọ ịkwado ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị , gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya ?
It is natural to be loyal to someone we love , such as a friend or a family member .
Obi na - adị anyị ụtọ ịkwado onye anyị hụrụ n’anya , dị́ ka enyi anyị ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị .
But because we are imperfect , our feelings can mislead us .
Ma ebe anyị bụ ndị na - ezughị okè , obi anyị nwere ike iduhie anyị .
So if someone we love is doing something bad and leaves the truth , we must remember that it is more important to be loyal to Jehovah than to anyone else . ​ — Read Matthew 22 : 37 .
N’ihi ya , ọ bụrụ na onye anyị hụrụ n’anya na - eme ihe ọjọọ , sikwa n’ọgbakọ pụọ , anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova ka anyị kwesịrị ịkwado karịa onye ọ bụla ọzọ . — Gụọ Matiu 22 : 37 .
How did one sister stay loyal to God in a difficult situation ?
Olee otú otu nwanna nwaanyị si gosi na ọ na - akwado Chineke mgbe nsogbu bịaara ya ?
If someone in your family has been disfellowshipped from the congregation , you can show Jehovah that you are loyal to Him .
A chụọ onye ezinụlọ unu n’ọgbakọ , i nwere ike igosi Jehova na ị na - akwado ya . Dị ka ihe atụ , e nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ana .
For example , one day Anne’s mother , who was disfellowshipped , called her on the phone to say that she wanted to visit her .
Otu ụbọchị , mama ya a chụrụ n’ọgbakọ kpọrọ ya na fon gwa ya na ya chọrọ ịbịa leta ya .
( See endnote . )
( Lee ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a . )
Anne’s mother said that she was very unhappy because the family refused to talk to her .
Mama Ana sịrị na obi adịghị ya mma n’ihi na ndị ezinụlọ ya ekweghị atụpụrụ ya ọnụ .
This made Anne feel sad , and she promised to reply in a letter .
O wutere Ana , ya ekwe mama ya nkwa na ya ga - eji akwụkwọ ozi zaa ya .
Before she wrote the letter , Anne meditated on some Bible principles .
Tupu Ana edee akwụkwọ ozi ahụ , ọ tụgharịrị uche n’ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl .
Then , in the letter , she explained in a kind way that her mother was the one who left the family when she sinned and refused to repent .
N’akwụkwọ ozi ahụ , o weturu obi kọwaara mama ya na ọ bụ yanwa hapụrụ ezinụlọ ha mgbe o mehiere ma jụ ichegharị .
Anne told her mother that the only way she could be happy again was by returning to Jehovah . ​ — James 4 : 8 .
Ana gwara mama ya na naanị ihe ọ ga - eme ka obi bidokwa ịdị ya ụtọ bụ ịlọghachikwute Jehova . — Jems 4 : 8 .
What qualities will help us to be loyal to God ?
Olee àgwà ndị ga - enyere anyị aka ịna - akwado Chineke ?
Loyal servants of God in David’s time were also humble , kind , and courageous .
Ndị ji obi ha niile na - efe Chineke n’oge Devid dịkwa umeala n’obi , nweekwa obiọma na obi ike .
Let us see how these qualities can help us to be loyal to Jehovah .
Ka anyị hụ otú àgwà ndị a ga - esi nyere anyị aka ịna - akwado Jehova .
Why did Abner try to kill David ?
Gịnị mere Abna ji gbalịa ka o gbuo Devid ?
Saul’s son Jonathan and the commander of Israel’s army , Abner , saw David bring Goliath’s head to King Saul .
Jọnatan nwa Sọl na Abna bụ́ onyeisi ndị agha Izrel hụrụ ka Devid buteere Eze Sọl isi Golayat .
Jonathan became David’s friend and stayed loyal to him .
Jọnatan metara Devid enyi ma na - akwado ya .
But Abner did not .
Ma Abna emeghị otú ahụ .
In fact , later he even helped Saul , who wanted to kill David .
Nke bụ́ eziokwu bụ na o nyedịịrị Sọl aka mgbe ọ na - agbalị igbu Devid .
Both Jonathan and Abner knew that God wanted David to be the next king of Israel .
Jọnatan na Abna ma na Chineke chọrọ ka ọ bụrụ Devid ga - achị Izrel ma Sọl chịchaa .
But after Saul died , Abner did not support David .
Ma mgbe Sọl nwụrụ , Abna akwadoghị Devid .
Instead , he tried to make Saul’s son Ish - bosheth king .
Kama ịkwado ya , ọ gbara mbọ ka o mee Ish - boshet nwa Sọl eze .
Later , Abner may have wanted to be king himself , and perhaps that is why he had sexual relations with one of King Saul’s wives .
O nwere ike ịbụ na Abna mechara chọọ ịbụ eze . Ọ ga - abụ ihe mere o ji dinaa otu n’ime ndị iko Eze Sọl .
Why did Jonathan and Abner feel so differently about David ?
Gịnị mere otú Jọnatan si lee Devid anya ji dị́ iche n’otú Abna si lee ya anya ?
Because Jonathan was loyal to Jehovah and was humble but Abner was not .
Ọ bụ n’ihi na Jọnatan kwadoro Jehova , dịkwa umeala n’obi , ma Abna akwadoghị Jehova , ọ dịghịkwa umeala n’obi .
Why was Absalom not loyal to God ?
Gịnị mere Absalọm akwadoghị Chineke ?
Absalom , King David’s son , was not loyal to God because he was not humble .
Nwa Eze Devid aha ya bụ Absalọm akwadoghị Chineke n’ihi na ọ dịghị umeala n’obi .
He wanted to be king , so he got “ a chariot and horses and 50 men to run before him . ”
Ọ chọrọ ịbụ eze . Ọ bụ ya mere o ji nweta ‘ ụgbọ ịnyịnya , nwetakwa ọtụtụ ịnyịnya na ndị ikom iri ise na - agba ọsọ n’ihu ya . ’
He also convinced many Israelites to be loyal to him .
O mekwara ka ọtụtụ ndị Izrel kweta ịna - akwado ya .
He even tried to kill his father , although he knew that Jehovah had made David king of Israel . ​ — 2 Samuel 15 : 13 , 14 ; 17 : 1 - 4 .
Ọ gbadịrị mbọ ka o gbuo nna ya Devid n’agbanyeghị na ọ ma na ọ bụ Jehova mere nna ya eze Izrel . — 2 Samuel 15 : 13 , 14 ; 17 : 1 - 4 .
How can we benefit from Bible accounts about Abner , Absalom , and Baruch ?
Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Baịbụl kọrọ banyere Abna , Absalọm , na Barọk ?
When a person is not humble and wants to have more authority , it is hard for him to stay loyal to God .
Ọ bụrụ na mmadụ adịghị umeala n’obi , na - achọkwa ka e nyekwuo ya ikike ma ọ bụ ọkwá , ọ ga - esiri ya ike ịna - akwado Chineke .
Of course , we love Jehovah , and we do not want to be selfish and wicked like Abner and Absalom .
N’eziokwu , anyị hụrụ Jehova n’anya .
But we must be careful that we do not start to desire a lot of money or a job that makes us feel important .
Anyị achọghịkwa ịna - achọ naanị ọdịmma onwe anyị ma ọ bụ bụrụ ndị ọjọọ otú ahụ Abna na Absalọm mere .
Ma anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyaukwu ghara ime ka anyị chụwa ego ma ọ bụ rụwa ọrụ ga - eme ka anyị bụrụ ndị ukwu n’ụwa .
This will harm our relationship with Jehovah .
Ọ ga - eme ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma .
For some time , Baruch , Jeremiah’s secretary , wanted something he did not have and was no longer happy serving God .
O nwere mgbe Barọk , bụ́ odeakwụkwọ Jeremaya , nọ na - achọ ihe ndị ọ na - enweghị , nke mere ka ọ ghara ịna - enwe obi ụtọ n’ozi ọ na - ejere Chineke .
Then Jehovah said to Baruch : “ Look !
Jehova sịrị Barọk : “ Lee !
What I have built up I am tearing down , and what I have planted I am uprooting ​ — the entire land .
M ga - etida ihe m wuru , m ga - efopụkwa ihe m kụrụ , bụ́ ala a dum .
But you are seeking great things for yourself .
Ma gị onwe gị , ị na - achọrọ onwe gị ihe ukwu .
Stop seeking such things . ”
Kwụsị ịchọ ya . ”
Baruch listened to Jehovah .
Barọk gere Jehova ntị .
And we must listen to him too , because soon he will destroy this wicked world .
Anyịnwa kwesịkwara ige ya ntị n’ihi na ọ ga - ebibi ụwa ochie a n’oge na - adịghị anya .
When you ask your brother to go to the elders for help , you are being kind to him and loyal to Jehovah
Ọ bụrụ na ị gwa nwanna ka ọ gakwuru ndị okenye ka ha nyere ya aka , ọ ga - egosi na ị dị obiọma nakwa na ị na - akwado Jehova
Show why we cannot be loyal to God when we are selfish .
Kọọ akụkọ gosiri na anyị agaghị akwadoli Chineke ma ọ bụrụ na anyị na - eche naanị banyere onwe anyị .
Daniel , a brother in Mexico , had to decide to whom he would be loyal .
E nwere otu nwanna bí na Meksiko aha ya bụ Daniel .
He wanted to marry a girl who did not worship Jehovah .
Ọ chọburu ịlụ otu nwa agbọghọ na - anaghị efe Jehova .
Daniel says : “ I continued writing to her even after I entered the pioneer service . ”
Daniel sịrị : “ Mgbe m malitechara ịsụ ụzọ , m ka nọkwa na - edegara ya akwụkwọ ozi . ”
But then he realized that he was just selfishly doing what he wanted .
Ma Daniel mechara ghọta na ya na - eche naanị banyere onwe ya , mata na ya anaghị akwado Jehova , nakwa na o kwesịrị ịdị umeala n’obi .
He was not being loyal to Jehovah , and he needed to be humble .
N’ihi ya , ọ kọọrọ otu nwanna bụrụla okenye ọtụtụ afọ banyere nwa agbọghọ ahụ .
So he told an experienced elder about the girl .
Daniel mechara kpebie onye ọ ga - akwado .
Daniel explains : “ He helped me to see that to be loyal to God , I needed to stop writing to her .
O kwuru , sị : “ Okenye ahụ nyeere m aka ịghọta na ọ bụrụ na m chọrọ ịna - akwado Chineke , m kwesịrị ịkwụsị idegara nwa agbọghọ ahụ akwụkwọ ozi .
After many prayers and tears , that is what I did .
Mgbe m kpere ekpere ugboro ugboro , beekwa ákwá , m mere otú ahụ .
Soon , my joy in the ministry increased . ”
N’oge na - adịghị anya , m malitere inwekwu obi ụtọ n’ozi ọma . ”
Daniel now has a wife who loves Jehovah , and he serves as a circuit overseer .
Daniel alụọla nwanna nwaanyị hụrụ Jehova n’anya . Ọ bụkwa onye nlekọta sekit ugbu a .
If you find out that your friend has committed a serious sin , will you talk to that person and make sure that he or she gets help from the elders ?
Ọ bụrụ na ị mata na enyi gị emeela mmehie dị́ oké njọ , ị̀ ga - agwa ya banyere ya ma hụ na ọ gakwuuru ndị okenye ka ha nyere ya aka ?
( See paragraph 14 )
( A ga - akọwa ya na paragraf nke 14 )
How did Nathan stay loyal to both God and David when David sinned ?
Mgbe Devid mehiere , olee otú Netan si gosi na ya na - akwado Jehova , na - akwadokwa Devid ?
When we are loyal to Jehovah , we can also be loyal to others and help them in the best way .
Ọ bụrụ na anyị na - akwado Jehova , anyị ga na - akwadokwa ndị ọzọ ma na - enyere ha aka otú kacha mma .
The prophet Nathan stayed loyal to Jehovah and was also loyal to David .
Netan onye amụma kwadoro Jehova , kwadokwa Devid .
After David had taken a man’s wife and then killed him , Jehovah sent Nathan to counsel David .
Mgbe Devid kpọọrọ nwunye onye ọzọ ma gbuo di ya , Jehova gwara Netan ka ọ gaa dụọ Devid ọdụ .
Nathan was courageous and obeyed Jehovah .
Netan nwere obi ike ma rubere Jehova isi .
But he also acted wisely and spoke to David in a kind way .
Ma , o mere ihe gosiri na ọ ma ihe .
He wanted to help David understand how serious his sins were .
O ji obiọma gwa Devid okwu .
So he told him a story of a rich man who stole the only lamb that a poor man had .
Ọ chọrọ inyere Devid aka ịghọta na mmehie o mere jọgburu onwe ya .
N’ihi ya , ọ kọọrọ ya banyere otu ọgaranya nke zuuru naanị otu nwa atụrụ otu nwoke bụ́ ogbenye nwere .
When David heard this , he got very angry at what the rich man had done .
Mgbe Devid nụrụ ya , ihe ọgaranya ahụ mere were ya ezigbo iwe .
Nathan then said : “ You are the man ! ”
Netan gwaziri ya , sị : “ Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ ! ”
David realized that he had sinned against Jehovah . ​ — 2 Samuel 12 : 1 - 7 , 13 .
Devid ghọtara na ya mehiere Jehova . — 2 Samuel 12 : 1 - 7 , 13 .
How can you be loyal to both Jehovah and your friend or relative ?
Olee otú ị ga - esi na - akwado Jehova , ndị enyi gị ma ọ bụ ndị ikwu gị ?
You too can be loyal to Jehovah first and be loyal to others by being kind .
Inwe obiọma ga - enyere gị aka ibu ụzọ na - akwado Jehova , na - akwadokwa ndị ọzọ .
For example , you may have proof that a brother has committed a serious sin .
Dị ka ihe atụ , i nwere ike ịhụ ihe gosiri na nwanna mere mmehie dị́ oké njọ .
You may want to stay loyal to him , especially if he is a close friend or a family member .
I nwere ike ịchọ ịkwado ya , nke ka nke , ma ọ bụrụ na ọ bụ ezigbo enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ unu .
But you also know that it is more important to be loyal to Jehovah .
Ma , ị makwa na ihe ka mkpa bụ ịkwado Jehova .
So like Nathan , obey Jehovah but be kind to your brother .
N’ihi ya , rubere Jehova isi ma jiri obiọma gwa nwanna gị okwu .
Tell him that he should ask the elders for help and that he should speak to them soon .
Gwa ya na o kwesịrị ịgwa ndị okenye ka ha nyere ya aka nakwa na o kwesịrị ime otú ahụ n’egbughị oge .
If he does not , then you should tell the elders yourself .
Ọ bụrụ na o meghị ya , i kwesịrị ịgwa ndị okenye .
By doing this , you stay loyal to Jehovah .
Ime otú ahụ ga - egosi na ị na - akwado Jehova .
And at the same time , you are kind to your brother because the elders can help him to have a good relationship with Jehovah again .
Ọ ga - egosikwa na ị dị obiọma n’ihi na ndị okenye nwere ike inyere ya aka ka ya na Jehova dịkwa ná mma .
They will correct him in a calm and gentle way . ​ — Read Leviticus 5 : 1 ; Galatians 6 : 1 .
Ha ga - ewetu obi ma jiri nwayọọ gbazie ya . — Gụọ Levitikọs 5 : 1 ; Ndị Galeshia 6 : 1 .
15 , 16 .
15 , 16 .
Why did Hushai need courage to be loyal to God ?
Gịnị mere Hushaị ji kwesị inwe obi ike ka o nwee ike ịkwado Chineke ?
Hushai was one of King David’s loyal friends .
Hushaị so ná ndị bụ́ ezigbo enyi Eze Devid .
When people wanted to make Absalom king , Hushai needed courage to stay loyal to David and to God .
Mgbe ndị Izrel chọrọ ime Absalọm eze , ọ bụ inwe obi ike nyeere Hushaị aka ịkwado Devid , kwadokwa Chineke .
He knew that Absalom had come to Jerusalem with his soldiers and that David had run away .
Ọ ma na Absalọm du ndị agha ya bịa Jeruselem nakwa na Devid agbaala ọsọ .
But what did Hushai do ?
Ma , gịnị ka Hushaị mere ?
Did he abandon David and support Absalom ?
Ọ̀ hapụrụ Devid , kwadowazie Absalọm ?
No .
Mba .
Although David was old and many people wanted to kill him , Hushai stayed loyal to him because Jehovah had appointed David to be king .
N’agbanyeghị na Devid emeela agadi mgbe ahụ , ọtụtụ ndị ana - achọkwa igbu ya , Hushaị ji obi ya niile kwado ya n’ihi na ọ bụ Jehova họọrọ Devid ka ọ bụrụ eze .
So Hushai went to the Mount of Olives to meet David . ​ — 2 Samuel 15 : 30 , 32 .
Ọ bụ ya mere Hushaị ji gaa izute Devid n’Ugwu Oliv . — 2 Samuel 15 : 30 , 32 .