sentences
stringlengths
17
659
Ike ịda jụụ otụ nkeji banyere oke ogbugbu na-eme n'ala Naijiria agwụla Ekweremmadụ
Osote onye-isi ndị ome-iwu Naịjirịa bụ Ike Ekweremadu ekwuola na ike agwụla ndị Sịnatị iji otu nkeji darajụụ akwanyere ndị egburu n'ime oke ọgbaghara dị na Naịjirịa oge ọ bula.
Ekweremadu katọrọ mwakpọ na ogbugbu ndị Naịjirịa aka ha dị ọcha nke ndị Fulani na-achị ehi mere, kwuo na ike agwụla ndị ome- iwu ịkwanyere ha ugwu n'otu nkeji'
Cheta n'otu ịzụka gara-aga ka emere akwam ozu mmadụ ruru iri asaa egburu na Local Gọọmenti Logo na Guma nke Benue Steeti, e be ihe kariri mmadụ iri ise ka akụkọ kwuru n'egburu na Taraba Steeti.
Ekweremadu gosiri iwe gbasara ogbugbu ndị mmadụ na nzukọ ndị ome-iwu n'ụbọchị taa, kwuo na Naịjirịa ga-ebu ụzọ nwe udo na nchekwa, tupu e kwuowa okwu iwulite obodo.
Ọ sịrị: "Ndị ome-iwu abụghị sọ ọsọ ndị ihe a metụtara, kama ndị Naịjirịa niile.
'Ike agwụla anyị iji otu nkeji dị jụụ maka nkwanye ugwu. Ihe anyị chọrọ bụ udo na nchekwa tupu echewa echịchị nwuli obodo."
Simone kwuru na ọ gaghị ekwe ka ihe mere zuru oọṅụ ya
Simone kwupụtara nke a n'elu igwe okwu, Twitta, jiri akụkọ a na-akpọ #MeToo na bekee.
Ọ sị na ọ gaghị ekwe ka ihe mere "zuru ọṅụ m na obi aṅụrị m."
O kwuru sị: "Ọ hịara m ahụ ị cheta ihe ndị a, ma na-agbawa m obi na ịlaghachi azụ ebe ahụ o mere dị mkpa na imezu ebumnobi m maka ị ga asọmpị Tokyo n'afọ 2020."
Mana Simone gwakwara ndị n'eso ya na ọ gaghị eme ha ihe nwute, na ọ ga-aga n'iru n'imeri na ihe ọ hụrụ n'anya bụ egwuregwu mmega ahụ.
Ndị uwe ojii wakporo, Larry Nassar, onye bụ dokịta ochie na-eleta ndị otu egwuregwu Amerika niile na Disemba afọ gara aga maka mpụ gbasara ụmụaka n'ịhe mmekọrịta nwoke na nwanyị.
Ihe dịka ụmụ nwanyị narị iri atọ akpụrụ la Nassar, bụrụ kwa ọka-mmụta na Mahadụm steeti Michigan, ga ụlọ-ikpe maka mmetọ o mere ha.
Nassar kwuputara na ọ metọrọ ndị otu egwuregwu Amerika ndị ọzọ.
Ọ bụ ka nke a na- aga ka Simone jiri kọ akụkọ nke ya.
Nwaanyị na eri ji na akara
Ọtụtụ mmadụ na arụ ọrụ aka, mọ na azụ ahia
Mgbe Muhammadu Buhari na-azọ ọchịchị, otu ịhe bụ okwu ọ kpụ n'ọnụ bụ nkwa ọ ekwere na ya ga enye ndị mmadụ ọrụ.
Okwu a Buhari kwuru na isi ndọrọndọrọ ọchịchị na 2015 bu ịhe eji kpụrụ ya na ọnụ ugbua, ọkachasị ka ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọnụ ọgụgụ a na-akpọ National Bureau of Statistics (NBS) nwepụtara ozi n'akọwa na mmadụ ruru nde asaa na nari ise so na ndị enweghi ọrụ kemgbe afọ 2016.
NBS kwuru nke a na akwụkwọ ọ kpọrọ "Labour Force Statistics Vol. 2: Employment by Sector Report,".
E wepụtara akwụkwọ a na Abuja n'ụka a gara aga.
Ke ihe ozi a pụtara?
BBC Igbo jụrụ Cheta Nwanze, bụ onye na arụ na SB Morgen bụ ụlọ ọrụ aka ha dị na nkọwa otu ịhe sịrị dị. Cheta gwara anyị na ihe dị na ọrụ nkọwa ihe ọgụgụ na enwe otu ọ dị, mana ọ sị na nnụkwụ ịhe mere na ụlọ ọrụ dị ichiche na Naịjịra n'ime afọ abuo gara aga.
"Achụrụ nwunye m na ọrụ mgbe Naịjirịa na ndị MTN nwere nsogbụ ọ were metụta ebe o na aru ọrụ. Okwu MTN ahu metutakwara ọtụtụ ụlọ ọrụ ha na ha na arụkọ ọrụ ka MTN ekweghị inye ha contract. A mam ọtụtụ ndị mmadu na arụbụ ọrụ na Proctor and Gamble, mana achụkwara ha n'ọrụ mgbe ụlọ ọrụ ahụ chụrụ oke anọ ndi ọrụ ha. Yabu ịhe metutara ọtụtụ mmadu," Ka Cheta Nwanze siri kwu.
Ụfọdụ ụmụaka (ọ bụrọ ndị egosiri eba) anọghịzị na akwụkwọ maka nne na nna ha enweghị ọrụ
BBC Igbo juru Nwanze maka okwu ndị gọọmenti Naịjirịa na ekwu banyere imepụta ọrụ.
Ọ sị na "nchọpụta ndị NBS na-akowa na ọrụ mmepụta mmanụ agbịdị agaghị n'ihu ka ọ sị kwesi. Nke a na egosị na agbaneghi na ego batara na ọrụ gbasatara mmanụ agbịdị, madụ ole ka ana ewo na ọrụ na mpaghara a? Mgbe e mere mgbakọ, ị ga ahụ na ịhe sirị ike ọfụma"
BBC Igbo kpọrọ ndị na-ekwuchịtere gọọmenti Naịjirịa ka ha kwuo uche ha banyere ịhe a NBS wepụtara mana onweghị onye zara n'ime ha.
Mana, gọọmentị Buhari weputara N-POWER, School Feeding Programme na ndị ọzọ dị na ime ịhe ha kpọrọ 'Social Empowerment Programmes' ha sị na ha ga ejị nyere ndị mmadụ aka na Naịjirịa.
Google na-echeta ụbọchị ọmụmụ Keshi
Iji cheta ọmụmụ onye nkuzi bọọlụ Najiria a ma ama bụ Stephen Keshi, Google kwanyere ya ugwu n'ụzọ pụrụiche site na ime ka akara e ji achọta ihe n'igwe intanetị bụrụ ihu ya.
Taa bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Jenuwarị 2018, bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Keshi onye nwụrụ n'afọ 2016 ka ọ gbara afọ 54.
Ihe i kwesịrị ịma maka Christy Essien-Igbokwe
Femi Otedola ekwetala ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ ruru $50,000 maka Christian Chukwu
Google Africa kwuru n'igwe okwu Twitter sị: "Taa, anyị na-akwanyere onye egwuregwu bọọlụ a ma ama, Stephen Keshi ugwu. Egwuregwu bọọlụ bugharịrị Keshi ụwa niile dịka onye ọgba bọọlụ na onye nkuzi bọọlụ. Ọnụ ọmụmụ, nna nnukwu!"
Ihe a Google mere, mere ọtụtụ ndị Naijiria obi ụtọ, mekwa ka ha chetakwa ndụ na ike Keshi kpara n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ na Naijiria mgbe ọ dị ndụ:
Keshi meriri iko mba Afrika na 2013
Mutiu Adepoju, onye ya na Keshi gbakọrọ Naijiria bọọlụ, gwara BBC na, "Keshi bụ onye hụrụ ndị mmadụ n'anya. Echetara m oge m banyere "National Team" mgbe ahụ ọ bụ onye ndu anyị, ọ bụ ezi onye ndu. Keshi bụ onye a ma ama. Ọ nọzịghị ndụ mana a ga-eji ihe ọma ndị o mere mgbe ọ dị ndụ were na-echeta ya."
Keshi chịrị ndị otu egwuregwu Super Eagles kemgbe afọ 2011 ma durukwa ha gaa asọmpi dị iche iche nke gụnyere; Iko Mba Afrika na 2013 (nke ha bulatara Naịjirịa), iko mpaghara Afrịka dị iche iche na 2013, ma nye aka wetara Naijiria ọnọdụ n'asọmpi Iko Mbaụwa niile na 2014.
Alexis Sanchez na-enye goolu nke ọma
Onye egwuregwu bọọlụ Alexis Sanchez e binyeela aka na akwụkwọ ndị otu Manchester United.
Manchester United jị nde euro ịrị na anọ (E14m) zụtara Sanchez n'aka ndị Arsenal.
Otu Manchester City kwusịrị mmasị ha n'ebe Sanchez nọ n'ịzụka nke gara aga makana ha che na nnabata Sanchez ga-emetụta emume ndị otu egwuregwu ha.
Manchester United ekwuola na Sanchez ga-eyi uwe akara asaa.
Sanchez ga-esokwa na asọmpị ndi Red Devils na otu di iche iche na English premier League akpọrọ FA cup ga-agba n'ubọchị ịrị na isii na ọnwa Januwari.
N'akụkọ yịrị ibeya Henrikh Mkhitaryan a baala otu Arsenal.
Sanchez na Mkhitaryan na ọnụ ogwụgwụ 4
Ka mgbe ọ bara Arsenal na afọ 2014, Sanchez enyela goolu ruru iri isi. Nani Romelu Lukaku, Sergio Aguero na Harry Kane bụ ndị ka ya nye goolu.
Na asọmpi ya niile Sanchez nyere goolu iri asatọ kari ndi eguregwu ọzọ na otu Arsenal.
Emerigo Arsenal ugboro atọ ka mgbe Sanchez kwụsịrị ịgbaru ha bọọlu.
Mkhitaryan agbaala ndị Manchester United asọmpị ru iri isi na atọ, nyekwa goolu iri na atọ.
Donald Trump na-ekwu okwu ike gbasara ndi mbịabịa
Ụlọ nzụkọ ome iwu US ekwekọrịtala maka itinye aka n'akwụkwọ ka ọrụ malite ọzọ na mba ahụ.
Cheta na ndị Democrat na ndị Republican sere okwu maka itnye aka na ya bu akwụkwọ maka ha ekwekọrịtaghị na ihe gbasara nkpata na mmefu akụ bụ bọjet.
Ndị otu Demokrat kwuru na ndị Republicans kwetara na ha ga-eme nkparịta ụka maka onọdụ ndị mbiambia bị n'ala US.
Ha ga-elebaanya n'iwu nke a na-akpọ Deferred Action for Childhood Arrivals (DACA) n'olu bekee bụ iwu na-agba mgbọ hụ na ndị umuaka ndị mbiabia nwere ike ị bị na US.
Trump na-atụrụ ndị ekwekọrịtara na mmeri ya aka.
Mana ugbua, ọchịchị Trump akabiela iwu ahụ. Nke a pụtara na iwu nke a ga-akwụsi n'ụbọchị ise na ọnwa nke maachị.
Onye na nọchịte anya ndị Demokrat n'ulọ omeiwu bụ Steny Hoyer arịọla ndị otu ibe ya ka ha lebaa anya na ya bụ okwu.
Maka akụkọ gbasara mmechi Amerika, gụọ:
Rochas na ala Fulani na achụ ehi
Ọtụtụ ndị Imo Steeti akwadoghị ị nye ndị Fulani na-achụ ehi ala
Gọvanọ na-achị Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na onweghị ala ya ga amaputa maka ndị Fulani na achị ehi n'Imo Steeti. Okwuru nke a unyahụ bụ mkpụrụ ụbọchị Jenụwarị iri abụọ na atọ n'ọwerri, isi obodo Imo Steeti.
Okwuru nke a site n'onu komishiona na-ahụ maka mgbasa ozi bụ ọkammụta Nnamdị Obiaraeri. Ozi ahụ kwuru na onweghị mgbe Gọvanọ Rochas jiri chee echichi ị nye onye ọbụla ala ndị Imo steeti.
O kwukwara na-asịrị niile ana anụ maka ịnye ndị Fulani na-achị ehị ala ndị Imo Steeti bụ ọrụaka ndị iro nakwa ndị mgbam na ndị ntụ.
Akwụkwọ akụkọ ekwubuola na Gọvanọ Okorocha sị na ya ga-enye ndị na achị ehị ala n'Imo Steeti nke ọtụtụ ndị Igbo katọrọ na ezoghị ọnụ. BBC Igbo gbara mbọ I kwuru Oje ozi Rochas maka mgbasa ozi mana nwaamadị ahụ bawara BBC mba gbanuọ ekwenti ya.
Ka ọdị ugbua, ndị Gọvanọ ndị ọzo n'ala ịgbo ekwuola na ha agaghị amapụta ala ọbụla maka ị nye ndị Fulanị na-achị ehị. Ohaneze Ndị Igbo akabichiela na onweghị onye ga enye ala ndị Igbo maka ịchị ehi.
Na River Steeti, Gọvanọ Nyesom Wike ekwuola na ya nweghị ala ya ji arụ ọrụ ma ya fọkwa nke ya na-enye mmadụ.
Obasanjo chịrị Naịjirịa afọ asatọ na ọchịchị onye kwuo uche ya
Obasanjo chịrị Naịjirịa afọ asatọ na ọchịchị onye kwuo uche ya
Dịka ọtụtụ ndị n'ekwenye na akwụkwọ a Obasanjo degara onyeisiala bụ Mohammadu Buhari na ọ bụ ihe ziri ezi, ụfọdụ ndị akatọla ya, kwuo na Obasanjo bụ onye ama ama n'idegara ndị isiala akwụkwọ.
Ugbua ka anyị were ohere a nyocha ihe ndị pụtara ihe na akwụkwọ a nke Obasanjo zigara onyeisiala Buhari nke ọkpọrọ igwu dịna emeghị nkeọma Gọọmenti etiti,
Enweghị nchekwa/nsogbu ndị ọchị ehi
Enweghị ọganihụ na olile anya
Ọkụ tanka agbala ọtụtụ mmadụ na oge gara aga na Legos
Onyeisi ndị na-emenyu ọkụ na, Legọọsi steeti bụ Rasak Fadipe ekwuola na onweghi onye nwụrụ n'ime ọkụ ahụ gbara n'ehihie ụbọchị 24 Jenuwarị, 2018.
Ọkụ tanka bu mmanụ ruru puku iri atọ na atọ n'ime ya, gbaara ọkụ n'Ojo, Lagos Steeti.
Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ na-agbaọsọ ndụ n'ebe ahụ.
Rasak Fadipe gwara ndị ntaakụkọ na "Ozugbo m nụrụ maka ọkụ a ka m kpọrọ ndị na-emenyụ ọkụ dị n'Ọjọ, ha gbatakwara ebe ọkụ a na-ere."
"Mana mgbe anyị ruru ebe a ka anyị hụrụ na ọ bụ mmanụ ụgbọala na-agba ọkụ. Ọ bụ mgbe ahụ m kpọkọtara ụlọọrụ ndị ọzọ na-emenyụ ọkụ ozugbo ozugbo."
Okwu mmanu ugbọala gbara n'uzọ ana-agbakarị
"Ndiuweojii na ndị agha mmiri nyere ndị Lagos State Emergency Management Agency (NEMA) enyemaka ịmenyụ ọkụ ahụ n'elekere atọ na nkeji iri atọ nke ehihe"
Olayinka Ajaba bụ onye nnọchịanya NEMA kwuru na nsogbu nke a sị n'oge ha jị aka na-amịpụta mmanụ ụgbọ ala .
Onye isi ndịuweojii n'Ijegun bụ SP Audu Ibrahim, gwara ndị ntaakụkọ na ha gbaara mbọ hụ na udo di mgbe ya bụ ọkwụ na-agba.
Ugbua, ndi obibi Ijegun Ibasa ekwuola na ha chọrọ ka gọọmentị Lagos steetị guzobe ulọ mmenyụ ọkwụ n'akụkụ ebe ahụ dika NAN sịrị kọọ.
E nịela ndị agha Amerịka nwụrụ na Niger
Ndị agha Amerịka si na ha na-eleba anya na ihe nkiri n'ewu ewu na intanet nke na-egosi ndị nwụrụ anwụ a sịrị na ha bụ ndi agha Amerịka ndị oyi egwu wakporo na afọ 2017 na mba Niger.
Ozi si na mpahara ndị agha Amerika na ahụ maka Afrịka a na-akpọ African command (USAFRICOM) siri: "Anyi na enyocha akara twitter bu ozi a, iji mara ma ọ bụ na ezi na onwere ihe nkiri so ya."
Ha kwukwara na ha agaghị ekwu ihe ọzọ banyere ihe a ma ọ bụrụ na ha emechaghi nyocha.
Na ọctoba 4, 2017, mmadụ iri na abuo ndị agha Amerịka na mmadụ iri atọ ndị agha Niger ka ndị oyi egwu wakporo na Tongo Tongo, bụ obodo di na ọdịda anyanwụ nke mba Niger.
Akụkọ na akọwa na ihe ruru mmadụ iri ise ndị oyi egwu ji ngwa agha dị ichiche, ọkacha ndị a na-akpọ machine gun na rocket-propelled grenade na asụsụ bekee bu ndi kpara arụ a.
Otu onye ndị nchọpụta dere na twitter na ndị oyi egwu a zipuru ihe nkiri a sikọrọ ozu ndị agha Amerịka na otu onye agha meruru ahụ.
Ndị agha a nọ na ọrụ ị nwete akụkọ maka ndị isi ndị otu otu egwu no na mpahara Niger ahu.
Ndị Amerịka nwere ihe ruru ndị agha nari asato na Niger, ụlọ nta akụkọ Hill, bụ ndị buru ozi a na mbụ, kwuru.
Thomas Dennerby di afọ iri ise na isi
Otu egwuregwu Super Falcons nke ala Naijiria enwela onye nkụzi ọhụrụ aha ya bụ Thomas Dennerby.
Onye isi otu egwuregwu bọọlụ na Naijiria bụ Amajụ Pinnick kwuru nke a n'elu Twita.
Super Falcons emeriela na asọmpi iko ụmụ nwanyị Afrika ugboro asaa
Ozigbo ụfọdụ ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n' anya nụrụ nke a ha bidoro na-ekele Pinnick n'elu Twita.