format
stringclasses
1 value
title
stringclasses
1 value
chapters
sequence
book
Eze Goes to School
{ "title": [ "EZE EJEE AKWỤKWỌ", "ỤLỌ AKWỤKWỌ DỊ N’AMA", "EZE AKỌỌ IHE NIILE MERE YA N’ỤlỌAKWỤKWỌ", "AGỤ AHỤ NA-ERI MMADỤ", "AKWAMOOZU", "EGO ADỊGHỊ MAKA ỤGWỌ AKWỤKWỌ", "MAAZỊ ỌKAFỌ ARỊỌ MAKA EZE", "EZE NỌ NA NSOGBU", "NWOKE BEKEE ABỊA OBODO AMA", "SENTRAL SKULU", "ỌGỤ A LỤGASỊRỊ N’ỤLỌ AKWỤKWỌ", "RỊZỌỌLTỤ ULE", "EGO AGỤMAAKWỤKWỌ N’EFU", "EZE ENWETA AGỤMAAKWỤKWỌ N’EFU", "IHE MBEREDE AHỤ" ], "content": [ "Eze Adị riri nri ụtụtụ ya bụ ụtara akpụ na ofe onugbụ a daghị n’ọkụ ọsọ ọsọ. Ọ bụ nri niile fọdụru na nri abalị ụnyaahụ. O mesịa chịpụga afere niile ya na nne ya jiri ri nri, wee pụa jewe Ama bụ obodo dị maịlụ atọ site n’obodo nke ha. Nke a bụ mbụ Eze na-eje akwụkwọ.\nN’ụtụtụ ahụ, Eze tetara mgbe oke ọkụkọ rahụrụ a mpio dị n’isi ụlọ nke ha kwara akwa mbụ.\nNne ya mụnyere lamp e ji aja ụrọ mee ka Eze ji anya ụra bilite n’ute ndina ya wee pịakọọ ya. O jee were atụ ya mgbe ọ na-apụ ije ịza ezi. N’ofufo chi, nchawa ihe ọnụ ụtụtụ, obodo Ọhịa niile dị jụụ, mana tupu o mesịa ihe ọ na- eme, o nwere ike ịhụtụ ndị dị iche iche na-esi n’otu mkpuke fee nke ọzọ. Ndị ọrụ ugbo na-amalite ije n’ugbo ha dị iche iche, ụmụ agbọghọ bucha ite n’isi ha echu mmiri, ebe ndị nne nwaanyị ji nkụ a wara awa amalite isi nri ha.\nEze na nwanne ya nwaanyị, Ụlụ buru ite mmiri ha soro ndị enyi ha gawa n’ụzọ mmiri. Ndị ọzọ zutere ha na-ajụrịta onwe ha “Ị bọọla chi?” Mgbe ha gwuchara mmiri, saa ahụ, Eze na Ụlụ gbajuru ite ha mmiri, wee si na mkpọda ndagwurugwu mmiri ahụ rigota wee lawa n’ụlọ ha. Mgbe ha na-aga n’ụzọ, ha zutere nna ha, Okonkwọ Adị, ka o konyere ọgụ n’ubu ya. Ọ na-eje n’ugbo ya dị ebe karịrị maịlụ ise igwute ji. Ọ sị Eze, ya gaziere gị n’ụlọ akwụkwọ.\nMgbe Eze na Ụlụ laruru ụlọ, ha chọpụtara na nne ha emechawala ihe niile, ma na-akwakọba nkata ya ọ ga-eji ga ahịa. O kpebiela na ebe ọ bụ na ya na Eze ga-aga obodo Ama dị anya, na ya ga-eweretụ ụfọdụ n’ime ji di ya kọtara ree. Ya mere, o kwakọbara ji, ogbe ọka na mkpụrụ akwụ n’otu nkata, akị na mkpụrụ anara, egwusi, onugbu na mgbọrọdị n’obere nkata nke Eze nwere ike ibuli. O bu n’obi iji ego ọ ga-ereta na ha zụta nnu, anụ, osikakpa na akpụ maka ezi na ụlọ ya. Site n’okpuru ihe nna ya ji ehiri isi, Eze wepụtara afe akwụkwọ ọhụrụ ya, sheeti ọcha na nịka na-acha ụpa ụpa. Nne ya kechiri ha n’akwa dị ọcha ma tinye ha na nkata. Mgbe ha jikere ịmalite njem ha, Nne Eze boro ya nkata akwụkwọ nri ahụ nke ọ ga-ebu gaa ahịa. Nne ya buru nkata nke ogologo, ha abụọ wee jebe Ama.\nEze na nne ya gafere Ọhịa nke dị na mgbada ugwu ebe ala dị mkpọgo na mkpọda. A rụkasịrị ụlọ n’ebe ukwu osisi dịgasị. Ha diketara ibe ha nso ma chee ihu ebe ndị nwe ha chọrọ. Ụzọ gbagwojuru anya gasasịrị ebe niile. Ndị ọbịa na- abịa n’Ọhịa dị ole na ole ma ọ dịbeghị onye kpasara maka nke a. Osisi tojuru ebe niile. Ọtụtụ n’ime ha bụ osisi a na-eri mkpụrụ ha eri, ole na ole n’ime ha bụ maka iche ndo.\nEze na Nne ya gafere ama, ebe sara mbara aja uzuzu juru a kụgasịrị osisi ndị na-enye ndo, wara wara ụzọ gara n’akụkụ osisi ndị a. Ụzọ ahụ gakwara banye obodo ọzọ nke ọ bụ oke ọhịa na ebe a na-akọ nri kewara obodo ndị a. Ha zutekwara ụmụ nwaanyị ka ha na-eje ahịa. Onye ọ bụla rutere na-ekele Eze na nne ya. Dị ka ha na-aga, ụmụ nwaanyị ndị a na-akọrị akụkọ na-achịkwa ọchị. Olu ha na-edekwa n’ime obodo mgbe ha malitere bụwa abụ.\nNke a mere ka ihe akụkụ ha bụ dịịrị ha mfe ma mee ka ha chefuo na ihe ha ka ga-aga wee rue ahia tere aka.\nE wezuga mmadụ ole na ole ma onwe ha, ụmụ aka ụmụ nwaanyi niile gbachitere onwe ha nkịtị. Eze, onye okike chị ya bụ ịnọrọ onwe ya nwayọọ, anaghị agwalinwu onye ọbịa okwu. O mechiri ọnụ ya karichaa mgbe ọ chọpụtara na ọ bụ naani ya bụ nwata nwoke nọ n’òtú ahụ. O nweghị ike ịgwa ụmụ aka ụmụ nwaanyị okwu. N’obodo Ọhịa, ụmụ aka nwoke na-ahụta onwe ha ka ndị dị elu karịa ụmụ aka ụmụ nwaanyị, ya mere Eze jiri atụrụ ha nkọ.\nN’ezie arọ nke ibu ya na ogologo ije nke ha gara amalitela ịbịa ya n’ahụ. Olu ya agbagọọla ebe ọ naghị agasikwa ije ike. O nweghị ihe ga-ewepụ uche ya n’arọ nke ihe o bu na-anyị ya na ebe nke fọdụrụ ha ka ga-aga.\nMana Eze, bụ nwata afọ asaa, nwere ume nwata afọ iri. Ọ bụ ezie na a gaghị eji ume ya tụnyere nke ụmụ agbọghọ ndị ahụ na ndị obere ụmụ nwaanyị bụ ndị jerela ụdị ije ahụ ọtụtụ oge ma ọ gbakasịghị ahụ ọ bụla, n’ihi na nna ya akụzierela ya idi ihe bịara ya na-enweghi mkpesa na ime ka nwaanyị ọ bụla mara na ọ nọ n’ihe mgbu. Ya mere Eze, ewezuga ịtụ egwu na ụmụ nwaanyị ahụ okachasị ndị obere agbọghọ ahụ ga-achị ya ọchị ma o kpesawa na-agbalisi ike igosi na ya bụ nwoke tozuru etozu na-ebido akwụkwọ ụbọchị ahụ.\nNne Eze chọpụtara oge adịghị anya na ike agwụwala nwa ya. Mgbe ha na-arigo ugwu nke bụ ebe ikpeazụ ha ga-agacha, njem ha agwụ ọ tụụrụ ya aka ebe ha ga-akwụsị, ọ sị ya, “ọ bụrụ na anyị gafee ukwu osisi mango ahụ, rue ebe ahụ, ‘e nwere ọdọ nkwụ, anyị ga-enwe ike ịhụ Ama. Ọ dịla nso ugbu a, ya mere; jisi ike” ụmụ nwaanyị ndị na-abịa n’azụ ha jụrụ ihe na-eme. Nne Eze sị “akpụ nwa m nwoke”\n“ejebeghị Ama mbụ. Ọ dị m ka ike agwụwala ya”\nNwaanyị ahụ kwuru si, “ọ kwanụ ka o si adị mgbe mmadụ na-eje ebe o jebeghị mbụ otu maịlụ na-adị ya ka abụọ, abụọ adị ka anọ wee dịrị gaba. Jisie ike nwa m. Anyị erubela ebe ahụ”.\nHa rutere n’ọdọ nkwụ ahụ nke dị n’elu ugwu, na mgbada ya bụ Ama, bụ ebe mara mma ile anya. Anwụ ụtụtụ wụkwasịrị nchake ya n’elu akwụkwọ osisi, ma n’elu akịrịka e jiri kpụọ ụlọ nakwa n’ahụ aja ụpa e jiri do ụlọ. Ukwu nkwụ, ukwu nkwụ jupụtachara n’etiti ụlọ na ụlọ nke na-egosi na eke kere ụwa mere obodo a mma.\nOtu o sila dị, Eze ahụghị ihe ọ bụla mara mma n’obodo Ama. N’ezie ihe ọ hụrụ mere ya ikwu okwu nke mbụ. Ọ sị, Nne, Ama dịkwa nnọọ ka obodo anyị, nne ya zaghachiri ya sị “N’ezie nwa m, naanị na o buru ibu karịa. Ị gaghị enwe ike ịhụcha ụlọ ya niile site n’ebe a. Ụfọdụ n’ime ha zochara n’okpuru nnukwu osisi ndị ahụ”\nEze chetara ihe butere ya Ama - ụlọ akwụkwọ - o wee jụọ nne ya ebe ọ dị.\nỌ zara ya sị, “Ọ dị n’okporo ụzọ ebe ahụ.” Ọ tụkwaara ya aka sị, “Ebe ahụ sara mbara dị n’ihu, ebe mmadu ole na ole nọ, bụ ebe ahịa dị”.\nHa jiri nwayọọ gbadaa ugwu ahụ si n’akụkụ ụlọ akwụkwọ ahụ gafee wee jewe n’ahịa ahụ. N’ahịa, ha buturu ibu ha, wee gbatịa onwe ha.\nNne ya sị ya, “Ngwa, gaa, yiri akwa gị ka m kpọrọ gị gaa ụlọ akwụkwọ” “Agụụ ọ na-agụ gị ka ị gachara njem a. Eze zara ya sị, “mba.” Nke a bụ, n’ihi na ọńụ o nwere maka ụlọ akwụkwọ ọhụụ hiri nne nke mere na afọ juru ya dị ka o riri nri. Nne ya tọghere akwa ahụ dị ọcha o ji kechie afe akwụkwọ Eze, were akwa dị n’ime ya nye ya. Mgbe o yiri ya n’ahụ, o karịtụrụ ya. Nna ya gotara ha n’ebe a kwara ha kobe. Nna ya ma na ọ zụta nke ya na Eze ha na ọgaghị ete aka Eze etofere ya.\nỤmụ nwaanyị ndị ọzọ na-ańụrịrị Eze n’uwe ọhụrụ ya. Nne ya gwara ha sị “Ọ na-eje akwụkwọ” O kwukwa na mwute sị, “ọ bụ mkpebi nna ya, ọ bụghi nke m”.\nNwaanyị nke ọzọ tiri mkpu sị “ijekwa akwụkwọ?” “Ara ọ na-awị gị? Ihe nna ya kpebiri! Ma I meghị ihe ọ bụla ịkwụsị ya!” N’oge ahụ, o nweghị nwoke ọ bụla n’obodo Ohịa jere akwụkwọ. Ndị obodo niile, ha niile bụ ndị ọrụ ugbo. O nweghị uru ịgụ akwụkwọ baara ha. Ọ dighị akụziri nwata nwoke ịkọ ji, ịrụ ụlọ, igbutu osisi, ma ọ bụ ịgba egwu ọdịnaala.", "Nne Eze sogidere ya rue ọnụụzọ ụlọ akwụkwọ ma legide ya ka ọ na-aga egwu egwu ịba n’ime ụlọ akwụkwọ. Egwu na-atụ nne ya dị ka ọ na-atụ ya. O guzoro n’okpuru ukwu osisi mango were na-elegharị anya.\nOgige ụlọ akwụkwọ ahụ ejighi nnukwu ihe bukarịa ama egwuregwu di n’ obodo nke ya. E ji osisi akwachaghị akwacha gba ya ogige gburugburu. N’etiti ogige ahụ ka ụlọ akwụkwọ n’onwe ya dị, nke na-ebukarịghị ụlọ nna ya. E ji aja ụpa doo ụlọ ahụ nke nwekwara ide e dopụtara bụ ya ji elu ụlọ akịrịka ahụ na- acha ụpa ụpa n’ihi etum ma na-achọkwa, ịda ada n’ebe dị iche iche.\nEze hụrụ ụlọ ọzọ n’aka nri ya bụ ụlọ be onye nkuzi. E ji nzu na-acha gbaa tee ya nke na-achakepụkwa n’anyanwụ ụtụtụ. Dị ka ụlọ akwụkwọ ahụ, e ji igu nkwụ a kpara ka ute kpuo elu ya. Ụlọ nke ọzọ di n’aka ekpe, bụ ụlọ ezumike ebe ndị na-agbasa ozi ọma na-elekọta ụlọ akwụkwọ na-edina ma ọ bụrụ na ha bịa n’Ama.\nE nwere osisi unere na-etogasị n’ala ahụ. Ebe ndị a kapụtara maka ịzọ okooko (fụlawa) ka dịkwa otu ahụ n’ihi na mmiri ezobeghị ka e wee rụọ ọrụ na ha. Eze aghọtaghị ihe niile ọ hụrụ mana o ji ndidi na-eche ihe ga-eme.\nỌ hụrụ igwe ụmụ aka nwoke na-abịa mana naanị otu nwata nwaanyị sonyeere ha. Otu nwoke si n’ụlọ ahụ e tere nzu ọcha pụta, wee gaa n’otu akụkụ ụlọakwụkwọ, si n’elu ụlọ fara okporo igwe há ka otu ntụ aka wee tụtụrụ kwa otu okporo igwe ugbo oloko nke nwere ihe mgbakọ n’otu isi ya. O jidere ya n’ihe mgbakọ dị ya wee were igwe ahụ na-akụ ya. Nke a bụ mgbịrịgba ụlọ akwụkwọ. Dị ka ọ na-akụ ya, ụmụ nwoke ndị na-abịabu n’ụlọ akwụkwọ ahụ bụ ndị Ama soro mgbịrịgba ahụ na-agụ egwu ka a na-akụ ya. Na-asị “ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị bịa akwụkwọ! “ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị bịa akwụkwọ!!”\nHa soro ya na-agụ egwu rue mgbe ọ kwụsịrị ịkụ ya.\nO mesịa kụọ aka ya, feere ha aka ka ha bịa.\nMgbe ha gbakọrọ ya gburugburu, ọ gwa ha sị “soronụ m baa n’ime ụlọ akwụkwọ. Ha wee soro ya ka o chigharịrị.\nN’ime klaasị, ha soro ya sekpuru ala mgbe ha hụrụ ya ka o sekpu ala. Ọ gwara ha mechie anya ka ha kpee ekpere, ha niile rubere isi, ọ bụ naanị otu nwata nwoke meghere anya ya. Onye ahụ bụ Eze. Ọ ghọtaghị ihe ọ ga-eji mechie anya ya ka a na-ekpe ekpere. Ọ hụbeghị onye ọ bụla metụtara ya ka o mechiri anya ya mgbe ha na-ekpe ekpere ma ọ bụ mgbe ha na-achụrụ mmụọ na-elekọta obodo ha anya aja.\nỤmụ aka ahụ kere onwe ha ụzọ abụọ mgbe e kpechara ekpere. Otu òtù fere mmiri n’ala ime ụlọ akwụkwọ ebe òtù nke ọzọ zara ya. Nke a amasịghị Eze. Ịza ime ụlọ bụ ọrụ dịịrị ụmụ aka nwaanyị, ma o rubere isi, n’ihi na nna ya kuziiri ya irube isi nye onye ọ bụla tọrọ ya, ọzọ nwoke a ruru ogo ịbụ nna ya.\nMgbe a zachara ihe, nwoke ahụ bara n’ụlọ e ji nzu ọcha tee, bute ukwu ute. Ọ gbasara ha n’ala ma gwa ụmụ aka ka ha nọdụ na ya. Mgbe ha niile nọdụchara ala, ọ malitere gụwa otu egwu obodo. O teghị aka ha malitere soro ya kwesiwe ya ike. Mgbe ha kwechara ukwe ahụ, ụmụ aka niile mesapụrụ ahụ. Ihe nwoke ahụ masịrị ha, mgbe Eze nọ na-eche onye nwoke ahụ bụ, o kwuru okwu sị “ọ ga-amasi unu ịma aha m?”\nHa niile zara ee n’otu “Abụ m Maazị Ọkafọ”\nAbụ m “Onye nkuzi ụlọ akwụkwọ a”.\nAbụ m enyi unu”. O chetụrụ obere ka nke a dabasịa, o wee jụọ, Gịnị bụ aha m? Ha niile zara n’egwu “Maazị Ọkafọ”. Ọ gwara ha sị “Egwu atụla unu.”Unu niile na-emehaala nke ọma agaghị m apịa unu ihe. Kwuo ya ọzọ, tisie ya ike ọzọ.\n“Maazị Ọkafọ”\nDị ka ọ gwara ha mee “Maazị Ọkafọ” mana unu agaghị akpọ m Maazị Ọkafọ mgbe unu na- agwa ndị mmadụ maka m. Ị ga-akpọrịrị m “Onye nkuzi”.\nHa niile tie, “Onye nkuzi\n“ọzọ”\n“Ọnye nkuzi”\n“ọzọ”\n“Ọnye nkuzi”\n“Unu ma ihe kpatara m ji asị unu kwugharịa ihe unu kwuru?” otu nwata nwoke sị na ya ma. Ọ bụ n’ihi na e kwuo ihe ugboro ugboro ọ bụla onye ntị chiri ga- anụ, Ọ ji otu ilu ndị be ha na-atụ were za ya.\nỌ jụọ ha sị “Gịnị kpatara na unu agaghị akpọ m aha mgbe unu na-agwa m okwu?\nEze chere na ya kwesịrị iso n’onye mbụ onye nkuzi ga na-ekwu maka ya. Otu nwata nwoke agbaala ya otu ọkpụ site n’ịza ajụjụ nke mbụ ugbu a ọ chọrọ ịgbapụ ya na nke a. Ọ bụ maka na anyị niile ahaghị,’. Ị tọrọ anyị niile, nna m gwakwara m na ị ma ihe nke ukwuu. Maazị Ọkafọ wee gwa ha si “ugbua unu niile n’otu n’otu ga-agwa m aha unu”.\nDị ka ha na-ekwu n’otu n’otu, ọ na-ede ya n’akwụkwọ “ugbu a achọrọ m ka unu gee ntị. Ọ bụrụ na ịnụ aha gị, ị ga-aza “Anọ m ebe a, nna m ukwu”. Nke a o doro unu anya?’ Ha niile tie ee.\nỤlọ akwụkwọ ahụ bụ ụlọ akwụkwọ ọhụụ. Mgbe ndị na-agbasa oziọma bụ ndị nwe ụlọakwụkwọ ahụ kpọrọ ndị okenye obodo Ama na obodo ndị ọzọ dị ha gburugburu tinyere Ọhịa ka ha kparịta ụka otu e nwere ike isi bidoro ha ụlọ akwụkwọ. Ha ekweghị bịa ọgbakọ ahụ. Ha achọghị ụlọ akwụkwọ, ọ ga-eme n’ọdịnihu na aka na-akọ nri ga-abụ ihe lara n’iyi. Kedụ uru mmadụ ịma agụ na- ede bara nye ọrụugbo?’ Bụ ihe ha jụrụ.\nObodo Ọhịa n’onwe ya nwere ọtụtụ ebe a na-akọ nri. Mana ọ bụ ala adịghị eme nri, nke mere ndị ebe ahụ ji alụsi ọrụ ike ịhụ na o nwere ihe ha wetara chaa. Ha enweghị ụlọ ọrụ ebe a na-emepụta ihe ọ bụla, ọ bụ ezie na ụmụ nwaanyị ha na-azụga obere ahịa, ya mere na ala bụụrụ ha ihe niile. Ndụ ha niile, ekpemekpe ha, omenala ha, ihe niile ha ji adị ndụ dabeere na ya.\nMana ọtụtụ ndị be ha, ndị hapụrụ obodo ha jee obodo mepere emepe ahụtala ụdị ibi ndụ ọzọ. N’ihi na ha enweghị ike ịgụ na ide, ọ hịara ha ahụ inweta ezigbo ọrụ. A na-ewe ha naanị n’ọrụ ịkọ ugbo, ndị ogwu aja na ndị òbú ibu. Ịgụ akwụkwọ ha abụrula ihe gafere agafe. Ichighakwa n’ụlọ akwụkwo agafeela mana o feela n’ebe ụmụ ha nọ?\nHa dere akwụkwọ zigara ndị na-agbasa oziọma bi nso Ama na-arịọ ha ka ha rụọrọ ha ụlọ akwụkwọ maka ụmụ ha. Ha kwuru na ha achọpụtala uru ịgụ akwụkwọ bara na otu ha siri chọsie ụlọ akwụkwọ ike maka ụmụ ha nọ n’ụlọ.\nN’ihi akwụkwọ ozi ndị a, ndị a na-agbasa oziọma wee rụọ ụlọ akwụkwọ n’Ama. Mana ndị okenye nọ n’obodo achọghị ya, ha nwara oko ha ịhụ na ha kwụsịrị ndị ezi na ụlọ ha ije ya.\nMaazị Ọkafọ, onye mbụ a kpọrọ ilekọta ụlọ akwụkwọ ahụ bụ onye Akụ, bụ obodo dị maịlụ iri na ise site n’Ama. Ọ bụ nwoke gbara agba, dị afọ iri atọ ma bụrụ onye hụrụ ụmụ aka n’anya. Ọ dịghị ka ụfọdụ ụmụ nwoke ndị ime obodo nwere ọtụtụ ndị nwunye. Ọ bụ naanị otu nwaanyị ka ọ na-alụ, n’ihi na ọ bụ ezigbo onye ụka. O nwere obere ụmụaka atọ, Maazị Ọkafọ abụghị onye nkuzi a zụrụ azụ, o nweghị ụkpụrụ usoro nkuzi ọ na-agbaso mana ụmụ akwụkwọ ya na-eme nke ọma n’ule niile n’ihi na usoro nke ọ na-agbaso na-ewepụta ihe ka mma n’ime ụmụ akwụkwọ ya.\nỤgwọ ọnwa a na-akwụ Maazị Ọkafọ pere mpe mana n’ihi na ọ naghị akwụ ụgwọ ụlọ ebe o bi, ọ bụkwa nwunye ya na-asachasị ihe niile a na-asacha asacha n’ụlọ. O siiri ya ike iji ego ya elekọta ezi na ụlọ dị mmadụ ise. Mana o nwere nnukwu ala ebe ọ kọrọ ji na akwụkwọ nri, ebe ụmụ akwụkwọ na-enyere ya aka mgbe ụfọdụ arụ ọrụ.", "Ụmụ aka iri abụọ bịara n’ụlọ akwụkwọ ọhụrụ ahụ n’ụbọchị mbụ mana naanị otu nwata nwaanyị a na-akpọ Chinwe dị ya. Ndị mụrụ ya anọọla n’ Ọnịcha bụ nnukwu obodo mepere emepe. Ha ahụla ụmụ nwaanyị na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ, na-arụkwu ọrụ nọọsụ n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ dị ka akawo na- edekọ ihe n’ụlọ ahịa gasị. Ụmụ aka ụmụ nwaanyị ndịa nwere ike inweta ọrụ ndịa n’ihi na ha gụrụ akwụkwọ wee mụta ka e si agụ na-ede. Ebe ọ bụ na Chinwe bụ naanị otu nwa ha nwere, ha kpebiri ịzụ ya ka o wee dị ka otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị ahụ ha hụrụ n’Ọnịicha.\nTupu akwụkwọ agbasaa n’ụbọchị ahụ, Maazị Ọkafọ gwara ụmụ akwụkwọ “Ọ bụrụ na unu laruo gwanụ ndị mụrụ unu ma ọ bụ ndị unu na ha bi ka ha zụtara unu sleeti na pensụl. Gwa ha na unu ga-asa ahụ tupu unu abịa akwụkwọ ụtụtụ ọ bụla na unu ga na-abịa akwụkwọ n’oge. Ọ bụrụ na ụlọ unu dị anya n’ụlọ akwụkwọ, gwa ndị be unu ka ha na-akpọte unu n’oge. Unu ghọtara ihe m kwuru? Ha niile zara, “E e”.\nỌ gwara ha sị “unu esila otu a, aza ihe”. Ezigbo ụmụ akwụkwọ na-aza ndị okenye “Oo nna m ukwu.” Ọ bụrụ na okenye ahụ bụ nwaanyị, ị ga-aza ya “Oo nne m ukwu”. Nke a o doro unu anya? Ha zara ya, “Oo nna m ukwu”. Maazị Ọkafo wee kwuo sị: “ugbua, oge ụla eruola” mana tupu nkea, sekpurunu ala ma mechikwanụ anya. Mgbe ha mechara ihe o gwara ha, o duru ha n’ekpere: O Chineke, duru anyị laa n’udo. Ekwela ka anyị daa ma ọ bụ kpọbie ụkwụ anyị na nkume. Ekwela ka anyị daa n’ọrịa.\nNyere anyị aka ịdị na-abia akwụkwọ kwa ụbọchị, ka anyị na-amụta ihe onye nkuzi na-akụziri anyị, ịbụ ezigbo ụmụ aka wee baara nne na nna anyị uru. Nyere ndị be anyị aka ịchọpụta na akwụkwọ bụ ezigbo ihe. Nyere onye nkuzi na nne na nna anyị aka. Ihe ndị a ka anyị na-arịọ site na Jizọs Kraịst Onyenweanyị Amen.\nHa niile zaa “Amen” ka o kpesịrị.\nEze chọtara nne ya n’ahịa. O rubeghị elekere mbụ nke ehihie mana o rechaala ihe niile o bu bịa ahịa ma zụtachaa ihe niile ha chọrọ n’ụlo. Ha na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ yịkọrọ wee laba. N’ihi na ha niile bụ ụmụ nwaanyị na n’ihi na ha anaghị akwụsị ịkọ akụkọ maka ahịa ha, Eze enweghị ọhere ịkọro nne ya ihe mere n’ụlọ akwukwọ. Ọ bụ enweghị ezigbo agwa bụ ịmanye ndị okenye aka n’ọnụ mgbe ha na-ekwu okwu. Ọ bụ mgbe nna ya si n’ugbo lata na mgbede ahụ ka Eze nwere ike ịkọ akụkọ ya.\nMgbe ọ hụrụ nna ya ka ọ na-alọta, ọ gbara ọsọ gaa zute ya n’ụzọ. “Ama m na i jere akwụkwọ taa”, nna ya kwuru Dị ka o bu nkata ji juru n’isi ya na-aba n’ụlọ Eze zara “Ee nna m” na-agbalị ka o gosipụta ihe ọ mụtara n’ụbọchị mbụ ya n’ụlọ akwụkwọ. Nke a nyere nna ya ọṅụ.\nỊ ga-abịa ka ị gwakwa m ihe ndị ọzọ maka ụlọ akwụkwọ ahụ.\nMgbe ha nọdụrụ ala, Eze jụrụ ya ma ọ ma aha onye nkuzi ha “mba, nwa m kedụ aha ya? ‘Maazị Ọkafọ’, Eze ji nganga kwu nke a, mana o kwuru na anyị agaghị akpọ ya aha ya na anyị ga na-akpọ ya onye nkuzi.\nEziokwu! nna ya maara ụma kwu ya na mgbagwoju anya “maka gịnị”\nN’ihi na anyị na ya ahaghị. Nke ọzọ, nke a na-egosi nsọpụrụ, Ọ bụ eziokwu, kedụ ihe ọzọ Maazị Ọkafọ gwara unu taa? O kwuru na ị ga-azụtara m sleti na pensụl. Eze zara Dị ka ọ na-agụkọ ha na mkpịsịaka ya ka ọ ghara inwe nke ọ bụla ọ ga-echefu. Nke abụọ, anyị ekwesịghị ịdị na-abịa leeti n’ụlọ akwụkwọ. Nke ato, anyị ga-asarịrị ahụ anyị kwa ụtụtụ tupu anyị ejee akwụkwọ. Nke anọ,anyị ga na-edebe akwa anyị ọcha.\nỌ tụrụ Eze n’anya na, nna ya jere n’akpati ọ naghị ekwe akpọghe, meghe ya weputa sleeti na pensụl. Ọ gwaghị Eze, mana n’ime akpati ahụ e nwekwara akwụkwọ abụọ e ji ede ihe, mkpịsị odee, pensụl na inki. Ọ bụ ezie na Okonkwọ amaghị agụ ma ọ bụ ede mana o kpebiri na nwa ya ga-agụ akwụkwọ, ebe ọ bụ na o biela Obodo, bụ isiobodo ha, ọ chọpụtala uru akwụkwọ bara. O kpebiela n’obi ya na Eze ga-agụrịrị akwụkwọ. Nke a mere o jiri soro ndị ahụ na-agba mbọ ịhụ na a lụrụ ụlọ akwụkwọ n’Ama. Ugbu a nrọ ya abịawala na mmezu, n’ihi na nwa nke afọ ya, Eze ejewela akwụkwọ.\nNna a, ị maara na otu n’ime ụmụakwụkwọ bịara n’ụlọ akwụkwọ taa bụ nwata nwaanyị aha ya bụ Chinwe.\n“Ugbu a gee ntị, nna ya hiri aka n’anya wee gwa ya sị “N’ule ọ bụla unu ga-ele, ị ga-eme nke ọma karịa ụmụ nwoke niile n’ule. Ị ga-abụrịrị onye nke mbụ mgbe ọ bụla. Ọ bụrụ na izuzube otu nwoke ewee gafee gị, ekwela, nwa m ekwekwala ka nwata nwaanyị ahụ, bụ Chinwe gafee gị”.\nỤtụtụ ọ bụla tutu, o jewe akwụkwọ ọ ga-aza ngwuru nna ya ma gaa na mmiri chute mmiri. Mgbe o si n’ụlọ akwụkwọ lọta, ọ na-eri nri ehihie, mụọ otu e si ede mkpụrụ abidii, gaa chutekwa mmiri, sonyere ụmụ aka nwoke, ịgba mgba, izo nzuzo, ịgba ụta na egwuregwu ndị ọzọ masịrị ha. Mgbe ụfọdụ ọ na- akụziri ụmụaka nwoke ndịa egwụregwụ ndị ha gwuru n’ụlọ akwụkwọ. Ihe ndịa na-atọ ha niile ụtọ.\nEze bụ nwata nwoke na-aghọta ihe ọsịịsọ, o nwere mmụọ icheta ihe. Ọ naghị echefu ọsịịsọ ihe ọ bụla onye nkuzi ya kuziiri ya. N’ọnwa nke asaa n’afọ, ụmụ akwụkwọ na Maazị Okafọ nọọrala ọnwa ịsịị, o kere ụmụ nwoke iri abụọ ahụ ụzọ klaasị abụọ, otu ụzọ ka ọ kpọrọ klaasị ọtaakara 1A ebe nke ọzọ bụ klaasị ọtaakara 1B. Ndị na-aghọta ihe ọsịịsọ ka Eze ndị erubeghị afọ asatọ ka o tinyere na klaasị 1A. Ha dị itoolu tinyere nwata nwaanyị ahụ bụ Chinwe.\nỌ bụ naanị Maazị Ọkafọ na-akụziri klaasị abụọ ndị ahụ. Ndị klaasị nke 1A, ọ na-akụziri ha ihe nke ha ga-eme n’afọ na-abịa. Ọ naghị egbu oge ọ bụla n’ihi otu ihe, ọ chọrọ ka mgbe ụmụ aka ahụ ga-eje n’ụlọ akwụkwọ nke dị n’obodo mepere emepe ka ha tutara ya ugo site n’ime nke ọma karịa ụmụ aka nwoke niile si n’ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ.\nNke abụọ o kwenyere na ngwa ngwa ụmụ aka mụtara ịgụ na ide, na ndị obodo ga-achopụta uru akwụkwọ bara ọsịịsọ.", "Ka mmiri mbụ zoro n’ọnwa nke ise n’afọ, a kụriri ala ma dozie ebe a ga- akụ fụlawa. Ndị Ama nyere Maazị Ọkafọ ala nke ọ kpọrọ ndị ọrụ wee jee sụchasịa, sue ya ọkụ ma kọwa ya. Mgbe mmiri zosibere ike, ụmụ aka zọrọ fụlawa n’elu obo aja e doziri maka ya. Maazị Ọkafọ kọrọ ji n’ubi ya. Dị ka ihe ọ kọrọ n’ubi ya na-eto, ụmụ akwụkwọ ahụ nyeere ya aka rụchaa ahịhịa n’ubị ya. N’oge igwuri egwu nke ụtụtụ, ụmụ nwoke ole na ole na-arụ ọrụ n’ebe ahụ; mgbe ụfọdụ kwa ma a gbasaa akwụkwọ.\nMgbe ụfọdụ ọ bụrụ na ha bịa akwụkwọ , ha na-ebutere ya ukwu nkụ. Ọ na-amasị ha ịrụrụ ya ọrụ n’ihi na ọ na-emeso ha nke ọma. Ọ bụ nwoke enweghị nsogbu nke na-akụziri ha ihe nke ọma.\nỌ bụghị naanị na ọ na-eme ha ka ha na-ege ntị n’ihe ahụ ọ na-akụziri ha - kama ọ na-agwakwa ha uru ọ bara bụ ibi ndụ n’ụkpụrụ omenala ndị be ha. Ọ na-eje n’ụlọ ha dị iche iche ịhụ na ha na-agụ akwụkwọ n’ụlọ, ma na-arụkwa ọrụ kwesịrị ka ha rụọ n’ụlọ ma marakwa ma ndị murụ ha na ndị ha na ha bi a na- elekọtakwa ha anya nke ọma. O teghị aka a maara Maazị Ọkafọ n’okirikiri ebe niile ụmụ aka na-agụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ si apụta. Ihe ya na-amasị ụfọdụ ndị okenye n’ihi otu o si eje be ụmụ akwụkwọ ya na obi ume ala ya. Ha niile ji nke a na-asọpụrụ ya. Na ngwụcha afọ, Eze gbara onye nke mbụ na klaasị. Obi dị ya ụtọ nke ukwu nke mere ya iji ọsọ gbalaa be ha nke dị maịlụ abụọ ịkọrọ ndị mụrụ ya akụkọ ọma ahụ. Ụbochị ahụ, e ji otu ọkụkọ sie nri abalị iji ñurị oñụ otu Eze siri mee nke ọma.\nN’afo na-eso ya, e bufere Eze na klaasị ọtaakara nke abụọ. Afọ ahụ gaara Eze nke ọma rue mgbe e wechara ihe ubi n’ọnwa Nọvemba. N’otu mgbede, agụ gburu otu nwata nwoke n’ogbe dị nke ha nso. Ụmụ nwoke nọ n’ebe ahụ jikotara onwe ha Dị ka otu ndị nta gaa chọọ agụ ahụ ụbọchị atọ mana ha enweghị ike ịhụ ya. Emesịa agụ ahụ burukwa otu obere nwata nwaanyị na-echu mmiri. Site n’ụbọchị ahụ gawa, o nweghị onye ọ bụla na-ahapụ Ọhịa. Eze anaghịzị eje akwụkwọ, ụmụ nwaanyị na-echu mmiri naanị mgbe ha na ụmụ nwoke ji ngwa agha, mma na ụta.\nO nweghịkwa onye na-eje ọrụ n’ugbo, mana mgbe ụbọchị anọ gasịrị ụfọdụ ezi na ụlọ enweghịzị ihe oriri. N’obodo Ẹze ha, nri ha nwere bụ n’ugbo ka ọ na-adị ọ bụghị n’ụlọ. Ya mere ụfọdụ umụ nwoke jiri jewe n’ugbo ha.\nOkonkwọ Adị jiri ọnụ ụtụtụ pụọ tinyere ụmụ nwoke ise ndị ọzọ ka ha jee weta nri n’ugbo ha nke Dị karịrị nso. Ụzọ e si eje n’ugbo ahụ di warawara nke ukwu nke mere na ha na-aga n’otu ahịrị, otu nwoke bu nkata na ọgụ ha niile. Ndị ọzọ niile jicha mma e somara esoma na ụta. Ọ bụ Okonkwọ du ha aga. Na mbụ ọ hụghị ihe ọ bụla na-egosi agụ ahụ ọ bụla ọwa ya. Ya mere, ha niile na- ekwuritara onwe ha okwu. Mgbe ha rigooro obere ugwu, Okonkwọ chigharịrị n’ebe ụzọ ahụ gbagọrọ n’ike.\nNa mberede, agụ ahụ si n’elu nnukwu nkume dị n’ebe ahụ, makwasị Okonkwọ n’elu. Mbọ akaekpe ya mịbara Okonkwọ n’ubu, arọ agụ ahụ wee tituo Okonkwọ, ha abụọ ju ala. Agụ ahụ dakwasị ya n’elu. Ọ bụ ezie na ihe a mere Okonkwọ na mberede ma ọ bụ nwoke siri ike. Ha abụọ wee tụrụgharịwa, kpọrewe mgbada obere ugwu ahụ. Okonkwọ na-eti mkpu ka ha abụọ na-alụ mana ndị ha na ya so jiri ọsọ gbapụ n’ụdị na ha gara ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa nyere ya aka. Tutu ha lọghachi, o jirila mkpụmkpụ mma ya sugbuo anụ ọhịa ahụ, mana ahụ afọghị ya maka na agụ ahụ ji mbọ ya merụchaa ya ahụ.\nOkonkwọ nwụrụ ka ụbọchị abụọ gachara. Iru uju na akwa dị egwu dị n’Ọhịa n’ihi na ọ bụ nwoke mmadụ niile na-asọpụrụ ma na-enwekwa mmasị n’ebe ọ nọ. E liri ya Dị ka dike n’ihi na ọ nwụrụ ka dike ebe ọ zọpụtara obodo niile na nnukwu ihe ọjọọ dakwasara ha.\nTupu Okonkwọ anwụọ, ọ gwara nwunye ya ka ọ hụ na Eze gara n’ihu ịgụ akwụkwọ ya, o pekata mpe rue mgbe ọ maara agụ na-edekwa. Ọ bụ ezie na nwunye ya anabatachaghị atụmatụ a, mana ọ nwara ike ya ịhụ na o mere ihe di ya gwara ya ka ọ na-achọ ịnwụ.\nNgwa ngwa ọ nwụrụ, ndị be ha nọgidesiri ike ikwu na olili ya ga-adị ka nke onye a maara aha ya.\nEwezuga ọkwụkwa nkịtị a na-akwa mmadụ ma ọ nwụọ, ogbe iri ndị ọzọ, ndị ritere uru n’ike a ọ kpara bụ ndị ha na ndị ọhịa si n’otu agbụrụ bịakwara ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ. Ha ga-akpọtakwa ndị egwu a maara aha ha n’otu aka ahụ, ndị niile bịara ga-eriju afọ nke ọma.\nOkonkwọ nọburii n’ọtụtụ òtù ndị be ha. Òtù niile ndị a nwere mmemme ha na-eme mgbe onye otu ha nwụrụ, ma mmemme ọ bụla na-ewe ọtụtụ ihe. Ha na-eme ya iji kewapụ onye nwụrụ anwụ n’ebe ndị otu ya dị ndụ nọ.\nMgbe ụfọdụ mmemme ndị a na-anọ ọtụtụ afọ, nke ga-abụ mgbe ọ bụla ndị nwe onye ahụ nwụrụ anwụ nwere ihe a ga-eji mee ya. N’ọnọdụ nke Adị, ndị be ha ekweghị ka agbasapụ mmemme ahụ agbasapụ nke gaara eme ka ego nne Eze ga-emefu dịtụ mfe kama ha kpebiri na a ga-emekọ ha niile ọnụ.\nỌ bụ maka gịnị? Iwe, nganga agadị nwoke dị gịrịgịrị ka mkpụrụ azịza, jụrụ nne Eze. Ọ maka gịnị? Ọ kwụghachiri nke a n’olu ike, Nwa nne anyị nwoke ọ bụ ogbenye nke na mmemme akwamoozu ya ga-abụ ihe a ga-eme ọtụtụ afọ? Ọ bụ na o nweghị ọtụtụ ji n’ọba? ọ bụ na o nweghị ọtụtụ ewu? Gịnị ga-eme anyị ga-eji chere?\nHa chọrọ ka ha mefuchaa ego na ji niile Adị nwere nke e nwere ike iji kwụrụ Eze ụgwọ akwụkwọ bụ ihe nne ya chere. Ya mere ọ sị, di m kwuru na nwa ya ga-ejerịrị akwụkwọ. Ọ bụrụ na e mee ihe niile gbasara akwamoozu a n’uju, o nweghịzị ihe ga-afọ iji kwụ ụgwọ akwụkwọ Eze na nke iji nye ụmụaka nri.\nMa Agụ gwara nne Eze sị; “Isi adịghị gị mma” Agụ bụ nwa okorobịa nwere nnukwu afọ nke na-enupụta n’ihu ma ọ na-aga. Ọ bụghị mmadụ siri ike; ọ na-ekwu ka ichoku, mgbe niile ọ na-eji okwu ọjọọ agwa ndị mmadụ okwu “kemgbe gị na nwanne anyị nwoke si n’Obodo lata, ọ bụ gị na-ekwu ihe na-eme n’ụlọ ya, ugbua ọ bụ na ọ nwụọla, ị na-eche na ị ga-achịkwa…”\nIwe ekweghị ka o kwuchaa, sị o doro m anya na di gị enweghị mgbe ọ gwara gị ka I ziga Eze akwụkwọ. Ọ bụ ụzọ nghọgbu isi wee dokwaara onwe gị ego kwesịrị ka e jiri kwaa ozu. Gịnị ka o ga-eji gwa gị ihe dị otu ahụ ebe anyị niile na-eme nke ọma na-anụghị ísì ụlọ akwụkwọ. Okonkwọ o nwere mgbe o jere akwụkwọ a kụziere ya otu ọ ga-esi rụ ọrụ rụta ihe ọ ga-eji bi ndụ? Mba. kedụ ụlọ akwụkwọ kuziri ya otu e si akọ ugbọ? Kedụ ụlọ akwụkwọ kuziri ya otu e si arụ ụlọ, alụ nwaanyị, elekọta ụmụ aka anya, otu o siri lie nna ya n’usoro omenala anyị? Kedụ ụlọ akwụkwọ kuziiri ya inye ndụ ya wee zọpụta ụmụ anyị? Kedụ ihe Eze na-achọ eje n’ụlọ akwụkwọ? Ọ bụ na ọ kaghị mkpa na a kwara nna ya nke ọma, bụ otu n’ime mmemme akwamoozu ndị dike anyị nwere n’obodo anyị?\n“Mba’; nne Eze kwuru n’obi ilu sị ọ bụrụ na Adị, onye maara na ọ ga- anwụ, chere na mmemme akwamoozu ya dị mkpa karịa, o kaara ịgwa m. Unu kwesịrị ịma na m na-eme ihe ga-amasi di m na ụmụ ya, nke bụkwa ụmụ unu n’otu aka ahụ.\nỌ bụrụ na ị chọpụtara na ha bụkwa ụmụ anyị otu ahụ, gịnị mere na ị gaghị ekpuchi ọnụ gị, gị nwaanyị nzuzu?”Agụ kwuru nke a n’iwe, ebe afọ ya na-ekwoli elu na-ekwoda ka ọ na-ekwu okwu. Mgbe anyị chọrọ ndụmọdụ gị, anyị ga-arịo gị ya. Mana ọ bụrụ na ị chọọ ime ihe masịrị gị, ọ bụ n’ụlọ nna gị ka ị ga-anọ eme ya, ọ bụghị n’obodo nke ị bụghị otu onye n’ime ha.\nỌ bụrụ na ị chọrọ na ọ ga-eje akwụkwọ nke ahụ gbasara gị. Iwe kwuru nke a ka ọ na-adọ agba ya kpọrọ nkụ aka. “Mana ọ bụrụ na nwa ahụ too dị umengwu, bụrụ ajọ nwa, ị ga-ata ahụhụ si na ya pụta.\nNwaanyị bere akwa; ọ bụ ugbua ka ọnwụ di ya bidoro imetụta ya. Ugbu a ka ọ hụtara mkpa nwoke nwere okwu aka ya dị, bụ nwoke iguzoro n’etiti ikwu na ibe na-achọ ihe ha ga-eme.\nO teghị aka e nwechara mkparịtaụka ezi na ụlọ a, agadi Iwe zipụrụ ụmụ okoro iri n’ọba Adi. Ha jere ugboro ise, n’otu nje, ha na-ebute ụkpa ji ise tụrụ elu. Mgbe ha butechara nke ise, ji niile dị n’ọba gwụrụ. N’ime ji niile Okonkwọ nwere na Ewu iri na abụọ machara abụba ka ha jiri kwadobe mmemme nke anụbeghị ụdị ya mbụ na be ha.", "A kara ụbọchi a ga-eme mmemme akwamoozu nna Eze. E zipuru ndị ozi ịga gwa ndị mmadụ na ndị òtụ dị iche iche n’obodo ndị ọzọ. A jụrụ ase mmanya site n’aka ndị niile na-ete mmanya (ụmụ diochi) mgbe chi ụbọchị ahụ na-efota, ekwe malite dawa gwawa ndị mmadụ, na ‘Okonkwọ Adị anwụọla’, ‘Adị bụ dike anwụọla’. Bịa kwanyere ya ugwu ikpeazụ. “Bịa kwanyere ya ugwu zuru oke.”\nTupu ehihie erue, ndị mmadụ sitere n’ebe dị iche iche na-enubata n’Ọhia, buruchaa ihe ha na-eke agba egwu na ngwa egwu ha. Ụmụ nwoke kechara nnukwu akwa n’okpu áta ha. N’ubu aka ekpe ha ka ha nyanyere akpa e ji akpụkpọ ewu wee mee. Ụfọdụ n’ime ha ji n’aka ha opi ọdụ enyi ma ọ bụ osisi ebe ndị okenye n‘ime ha ji mkpọ́ toro ogologo.\nNa mbụ ha na-abata abụọ abụọ e mechaa ha bịawa n’iri iri, n’ikpeazu, n’òtú iri abụọ na iri atọ. Onye ọ bụla bịara na-ebu ụzọ gaa hụ ndị ihe mere na nwunye ya ịsị ́ha ndo. Tupu ọkara ụbọchị, ndị mmadụ ejupụtala Ọhia.\nỤda ikwe nri a na-asụ n’azụ ụlọ na-adapụta n’ihu ebe ahụ ụmụ nwaanyị na-agbagharị bụrụchaa afere na nnukwu ite ọna ofe ma ọ bụ akpụrakpụ nri ji na akpụ ma ọ bụ nri ọka e sere ese. Ụfọdụ bụ nri ndụ a ka ga-esi esi. Ndị ọzọ na- ebubata nri n’ite ofe dị nnukwu ọkụ na anụ a mịrị amị nke ha kwadoro na be ha dị iche iche ha chọrọ inye Dị ka ihe ha ji akwado ihe a na-eme. Ọsịsọọ na- atasịsị ha n’ahụ Dị ka ha na-agbagharị ịhụ na a kwadoro ihe niile.\nNdị ọbịa n’onwe ha nọ n’ụlọ dị iche iche ebe ha nọ na-eyikọrọ ihe ndị ha ga-eji gosịpụta ihe ha mụrụ n’ehihie ahụ.\nMgbe e richara oriri, mmemme akwamoozu biiri ọkụ. A gbara ọnụ egbe mkpọnaala asaa iji gosi mmalite ya. N’ụfọdụ ụlọ ahụ, otu ndị na-achụ nta nọ na-akụ ịgba ha. Ụda osisi, ogene, ekpiri na ụda egbe sonyekọrọ ụda ịgba ahụ a na-akụ. Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nọcha n’akụkụ ama obodo Ọhịa. Dị ka ha nọ na-eche, ụda ihe egwu dị iche iche na olu ndị na-abụ abụ na-adakọrịta na- abịa nso tutu rue mgbe òtù ndị na-achụ nta bụ ndị nke mbụ jiri bata n’ama ahụ.\nHa bụ otu ndị na-achụ nta n’Ọhịa. Otu a bụ ndị mbụ bu ụzọ bịa n’ihi na ọ bụ ndị Ọhịa nwe ama ahụ nke ọzọ Okonkwọ Adị bụ otu onye n’ime ha. Ndị otu a ji akwa dị iche iche kee ekike. Onye ọ bụla na-achọkwa ka a hụta ya ka onye dị egwu karịa ibe ya. Ụfọdụ tere akụkụ ahụ ha ụfọdụ ihe dị iche tekwa ihe ọzọ n’akụkụ nke ọzọ. Ndị ọzọ ji ihe iche iche tụkasịa ahụ ha niile. Ha nile yi akwa elu e ji agwọ ngwọ mee, okpu e ji okpokoro isi anụ mee na akpụkpọ anụ e ji eke ya. Ha niile bucha ube, mma na egbe cham Mgbe adịghị anya, òtú ndị ọzọ malitere batawa n’ama. Dị ka otu ọ bụla na-abịa, ụda ịgba na-agawanye n’ihu tutu rue mgbe e nwere ike ịnụ ha site n’ebe dị anya. Ndị nta ahụ na-egosịpụta otu ha sị agba anụ site n’ime ka ha hụrụ anụ bi n’ọhịa, otu ha ga-esi zoo na-eche ya rue mgbe ha gburu ya.\nMgbe ndị nta ahụ bịachara, otu egwu ndị ọzọ Dị ka egwu etiliọgwụ bịara. Ha na-awuli elu ma were ikpere wụda n’ala na-emerụghị ahụ. Ha na-edina n’ala ma na-atụgharị na-enweghị ihe na-enyere ha aka. Ha na-awụgharị n’ụzọ dị iche iche ma na-atụkwa ọkpa egwu hịara ahụ. Otu ọ bụla na-achọ ka ha gbakarịa ibe ha. Dị ka ngedegwu e ji osisi nke e kegidere n’ogwe unere abụọ na-ada, ha na- etu onwe ha aha otutu ma na- echetara òtú ọ bụla asompi na ihe ngosi dị iche iche ndị bu ha ụzọ megasịrị ọfụma.\nN’ụbọchị nke na-eso ya, ụmụ aka malitere na-agagharị n’obodo. Ọ bụ otu nwaanyi na-abụ abụ na-edugharị ha ọ na-abụ, ha na-azaghachi ya. N’ụlọ ọ bụla, nwaanyị ahụ du ha ga-agwa ha ka ha gbaa egwu. A na-enye ụmụ aka ahụ onyinye ego na ọkụkọ.\nN’ehihie, a na-akwụsị n’ihi oke anwụ na-acha. Ngwa ngwa ọ kụchara elekere atọ nke ehihie ụmụ aka ụmụ nwaanyị Ọhịa na-etecha ahụ ha dum ihe, dozikwa isi ha n’ụzọ magburu onwe ya, gbaa egwu n’etiti ama. Ụmụ nwaanyị Ọhịa na-esokwa ha n’azụ, otu abụọ ndị a ga-agba egwu n’ụdị ha na-agbabeghị mbụ bụ ụdi ha gana-echeta mgbe niile. Dị ka ha na-agba egwu, onye ọbụ abụ ji abụ akọ akụkọ ndụ Okonkwọ Adị, Dị ka onye hụru ndị be ha n’anya nke ukwu nke na o nyere ndụ ya n’ihi ha.\nDị ka akụkọ na-aga, ụmụ nwaanyị ndị ahụ na-agbasi egwu ike. Mgbe o ruru n’ebe agụ ahụ nọ wee bagide ya, ọtụtụ n’ime ndị na-agba egwu na ndị na- elele ha na-adapụ n’akwa. Ha dapụrụ n’akwa arịrị ka ha chetara otu Okonkwọ dị ka e bubatara ya na ozu agụ ahụ dọgburu ya, mgbe ha chetakwara oke ihe mgbu ọ gabigara, obi gbawaa ha. N’ụbọchị ahụ mmemme ahụ kwụsịrị n’oge.\nN’ụbọchị ndị ọzọ na-eso, mmemme akwamoozu ka na-aga n’ihu. Òtú ụmụ agbọghọ ọhụru gbara egwu n’oge ehihie. N’izu ahụ niile, ihe oriri gbara kasa, ndị mmadu na-eri na-agba egwu otu ike ha ha. Ihe niile e mere na mmemme a tọrọ Eze ụtọ. Ndị mmadụ na-emeso ya ka eze. Mgbe niile a na-enye ya ihe ọ ga-eri. Mgbe ọ hụrụ na ọ gaghị ericha ihe niile e nyere ya, o were ụfọdụ na-enyetụkwa ụmụ aka ndị ọzọ bụ ndị na-esogharị ya. Ọ dị Eze ka mmemme a bụrụ ihe ga-adị ebighi ebi, mana o mechara kwụsị.\nN’ụbọchị nke asaa, bụ ụbọchị ikpeazụ nke mmemme ahụ, ụdị mmanwụ dị iche iche pụtara. E nwere ndị obere na ndị buru ibu, ndị gịrịgịrị na ndị gbara agba, ndị ogologo na ndị mkpụmkpụ, ndị mara mma, ndị jọrọ njọ, ndị ji nwayọọ eje na ndị na-eme ọsịịsọ, ndị na-adighị emesi ike kama ha ji egwu ha na-agụ, na-agbakwa eme ndị mmadụ ọbi ọma. E nwere ndị ọjọọ na-emebisi ihe ndị a na-amanye ụdọ n’ukwu iji dọghachi ha mgbe ha chọro imebi ihe; ndị na- eme aghara, ndị na-ebute ihe mgbagwoju anya nye ndị na-elele ha. O nwere ndị na-akpa ọchị site n’akụkọ ha. E nwekwara ndị na-eme anwansị Dị ka ịrụdo osisi aka, osisi ahụ akpọnwụọ, iwufe ụlọ, ibu nkata anwụ na-agba agba ma ọ bụ ibu ọkụ n’isi ha. Ndị mmadụ gbaara anya ha nkiri n’ụbọchị ikpeazụ a. Ọ bụkwa ụbọchị e siri ji na ewu Okonkwọ Adị fọdụrụ. N’ime ya ndị mmadụ erichanwughị ha niile.\nE nyere Okonkwọ Adị ugwu a na-enye dike. Mana nwunye ya na ụmụ ya ga-ata ahụhụ n’ihi nke a.", "Eze agafeela na Standadị I e wepụtara ọhụru na ngwụcha afọ. Ugbua, ọ di afọ itoolu, ọ na-ebu na-esi ike mana ọ naghị etowanye ogo. O topụtala dị gịrịgịrị, dị nkọ ma dịkwa uchu n’ịghọta ihe.\nUgbua e nweela ụmụ nwoke dị iri anọ n’ụlọ akwụkwọ Maazị Ọkafọ. A rụgharịala ụlọ akwụkwọ ahụ ka o buo ibu ịbata ọnụọgụgu ụmụ akwụkwọ. Maazị Ọkafọ bụ onye na-enweburi mmasị n’egwuregwu bọọlụ mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụkwa naanị ya bu otu egwuregwu ọ hụrụ n’anya. N’obere ohere o nwetara, o webatara nke a n’ụlọ akwụkwọ ahụ nke na-eweghị ụmụ nwoke oge ịmụta ya. Eze na-emekwa nke ọma n’egwuregwu a. Ịgba ọsọ na ịwụli elu nyeere ya ezigbo aka. Ọ dịghị anya ha latachara ezumike Isita, nne Eze dara n’ọrịa. Ihe mgbu o nwetara n’ọnwụ di ya na ngharịpụ o nwetara site n’otu ụmụ nne di ya siri laa akụ di ya n’iyi tinyere mgbakasị ahụ ọ na-enwe n’ime ọnwa ole na ole ndịa mere ka ọ daa n’ọrịa.\nMgbe nne Eze nọ n’ọrịa ka Eze chọpụtara uru nna ya bara Dị ka onyeisi ezi na ụlọ. Ugbua ọ na-achọ ka ọ rụọ ọrụ Dị ka nna bi n’ụlọ. Ọtụtụ abalị, ọ na- anọdebe nne ya ahụ adịghị ike Dị ka nna ya na-eme mgbe ọ bụla ahụ adịghị nne ya. Mana ọ bụ nwata, ọ bụ ezie na ọ na-agbalisi ike ịmụ anya mana ụra anaghị ekwe ya wee rue na o dina ala rahụ ụra.\nEze sụchasịrị ala dị n’ụsọ ụlọ ha. Ọ kọrọ ya were akpụrụ ewu na ntụ fesa na ya. Ihe niile ha mere n’ugbo ha dị n’ụlọ akwụkwọ ka ọ na-emekwa na nke ya dị n’ụlọ. Ọ bụ ụbọchị e tinyere ihe ndị ahụ ga-eme ka ala mee nri nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ka ọ na-etinyekwa na nke ụlọ ha; ọ na-akụnye mkpụrụ na ya, ụbochị ha kụnyere n’ụlọ akwụkwọ.\nE nwere ọtụtụ ewu n’obodo Ọhịa. Ịchụ ha ka ha ghara ịta ihe ọ kụrụ, nwa nne ya nwaanyị bụ Ụlụ nyeere ya aka gba ogige siri ike gburugburu ala ahụ.\nN’ugbo ya, Eze kụrụ tomato, mgbọrọdị, egwusi, yabaasị, ose na ọkwụrụ. Ọ na-elekọta ha Dị ka a kuziiri ya n’ụlọ akwụkwọ. Eze akwụsịghị ebe ahụ. Ha nwere ukwu oroma abụọ, a kụrụ ụbọchị a mụrụ Ụlụ, kụọ nke ọzọ ụbọchị a mụrụ Eze. Ehihie ọ bụla ọ latara akwụkwọ, ọ na-aghọrọ oroma ole o nwere ike ibu n’obere nkata buru ya jee Ama. N’ụtụtụ, ọ na-ebili n’ezigbo oge rụọ ọrụ dịịrị ya ma burukwa oroma jee n’ahịa dị n’Ama. N’ebe ahụ, o na-eresị ya ndị mgbere tupu akwụkwọ ebido. Mgbe ọ lọtara, ọ na-ewere ego o retara mgbe ụfọdụ nye nne ya, ma mgbe ụfọdụ, o nye nwanne ya nwaanyị maka nri ha.\nMgbe ahụ dịchara nne ya mma, ọ zụtara Eze obere akpa o ji etinye ego niile o retara n’ihe o wetara n’ugbo ya na oroma ọ na-ebu eje Ama. Mgbe oge ruru ha ga-akwụ ụgwọ akwụkwọ nke taam nke atọ, o nweghị ego ga-ezuru ya. Nne ya siri n’ego ndị o dobere wee mezue ya. Ọ gbara mbibi ego o jiri zụtara ya afe akwụkwọ n’ihi na nke ochie adọkasịala. Na-agbanyeghị n’ihe o nwere ịrụ n’ụbọchị hiri nne, Eze na-eweputa oge isonye n’ihe a na-eme n’obodo. Na ngwụcha izu, ọ na-eteta n’oge sonyere ndị ọgbọ ya n’ịrụcha na ịzachasị ama ma ọ bụ ịmezi oche ogugu a rụrụ n’okpuru osisi. Ọ na-eso nne ya jee n’ugbo akpụ ya buru ole o nwere ike ibu wee lọta. O mesịa, ọ sụọ akwa ya. N’ehihie, Eze na- akụkwa egwu n’obodo mgbe ọ bụla e nwere ndị ga-agba egwu ma ọ bụ mgbe mmanwụ na-agba ma ọ bụkwanụ mgbe e nwere akwamoozu.\nN’afọ ahụ, Chinwe Ndụ naara Eze ọnọdụ nke mbụ ya n’ule nke e ji efegha klaasị. Eze si n’ụlọ akwụkwọ bere akwa lọta ma jụ iri ihe ọ bụla na mgbede ahụ. Ọ bughị na ọ bụ onye nke abụọ na-ewutekarịsị ya kama na ọ bụ nwaanyị naara ya ọnọdụ ya.\nKa afọ rugharịrị, ihe sibeere ezi na ụlọ Eze ike. Ukwu oroma ha abụọ nwụrụ na-amaghị ihe gburu ha. Ihe niile kpọrọ nkụ, ugbo Eze jupụtara n’ákúku na-anwụ anwụ. Ebe ha si enweta ego bụ naani n’ugbo akpụ nne ya, nke o bụ ọkara n’ime ya ka akpụ ka dịzị. Ego ha na-ereta n’akụ ha tiri bụ nke ha ji emeju nke a.\nNa mbụ ọ Dị ka ihe ọma na-achọ imere ha. Ụlụ nwa nne Eze lụrụ di. Di ya bụ onye Ama. O nyere nne ya na ụmụ nne nna ya ndị nwoke ihe onyinye Dị ka ọ bụ omenala na nwoke na-achọ ịlụ nwaanyị ga-egosi ndị mụrụ nwa ọ na- achọ ịlụ na ya toruru ogo ilekwata nwaanyị ahụ nke ọma.\nỌ bụrụ na onye na-achọ ịlụ ya bụ onye ọrụ ugbo, ọ bụ ji na mmanya ka ọ ga-eweta, ọ bụrụ na ọ na-aru ọrụ n’ebe ozo, ọ ga-eweta ego. Di Ụlụ onye bụ́ onye amị (soja) wetaara ndị be Eze ego dị pọụnd iri anọ. Iwe, nwa nne nna Eze jichiri ego ahụ sị na ya ga-edebere ya Eze rue mgbe Eze chọrọ ịlụ nwaanyị. Nne ya siri ọnwụ sị na a ga-enyerịrị ya ego ahụ Dị ka ọ dị n’omenala mana Iwe jụrụ ajụ, ndị Okenye kwado ya.\nYa mere, ihe na-aga n’ihu na-esiwanyere Eze na nne ya ike. O rere ihe ụfọdụ o nwere n’ihi agụụ na ịkwụrụ Eze ụgwọ akwụkwọ mana ego o nwetara ezughịrị ha ọ bụladị iri nri.\nEze na-ewetakwa ole o nwere iji nye aka. Ọ na-ekwe ọtutụ ọnya n’ọhịa ma na-ekpe ekpere abalị ọ bụla ka ọnya ya mata anụ Dị ka oke ọhịa nke ọ ga- ere. Ọnya ya na-egbute otu anụ ma ọ bụ nke ọzọ abalị ọ bụla. O nwekwara ndị ọzọ na-emekwa otu ihe ahụ nke mere na anụ na-asụkọ n’ahịa mee ka ọnụahịa ha dị ala.\nỌ dịghị anya, ọ dị ezinaụlọ Eze ka ihe isiike ha na-akarị ha, karịsịa na Eze ga-akwụsị ije akwụkwọ. Nwanne ya nwaanyị gaara enyere ha aka mana a tụfere ya na dị ya gaa ugwu. Nke a bụ oge a na-alụ agha abụọ nke mba ụwa. Otu e si ebugharị ndị agha (soja) bụ ihe a na-eme na nzuzo karịsịa ọ burụ na ha na-eje n’ihu agha. Nke a mere na Eze na nne ya enweghị onye ọ bụla ha ga- agbakwuru.", "Ọ dịghị anya Maazị Ọkafọ matara maka ihe isiike dị iche iche Eze na nne ya na-agabiga. Ọ wutere ya hinne n’ihi na ihe Eze na-amasị ya; Eze bụ otu n’ime ụmụ nwoke ma akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ha. O jere leta ha ma ghọta site n’ọnụ nne Eze udị ihe isiike ha nọ n’ime ya.\nO kpebiri ịrịọ ndị Ọhịa ka ha nye aka ịkwụrụ Eze ụgwọ akwụkwọ. Mgbe ọ kwadochara otu ọ ga-esi hụ ha na mgbede echi, ọ laa be ya.\nNa mgbede echi ya, ọ bịara Ọhịa. Ndị okenye zukọrọ na be Chike. Chike bụ onye bụkarịsịrị okenye n’Ọhịa. Ha na-ewe ya Dị ka eze ha. Ọ bubu nwoke toro ogologo, maa mma ma ugbu a, o hujiela werezie mkpọ na-aga, uwe mwụda ọcha o yi Dị ka ihe a na-ahụ n’agba ochie baịbụlụ n’ihi na ntutu ọcha juputara isi ya, ogologo afụọnụ ọcha kpuchie ihu ya.\nNdị nọ na nzukọ ahụ bụ Iwe na Agụ, ụmụ nne nna Eze, Bosa mkpụmkpụ nwoke nwere obosara obi na aka fụrụ afụ nke ọma. Achike ọkamgba a ma ama; Ụka, dibịa afa; na Aso, nwoke dị ganịganị ma tookwaa ogologo, nke Dị ka ọ ga-agbaji abụọ.\nMgbe o kelechara ha ekele onye ọ bụla gbara nkịtị.\nMaazị Ọkafọ wee sị “ọ bụ maka Eze Adị ka m jiri bịa ka m hụ unu. Ama m na unu agaghị aghọtehie m ma ọ bụrụ na m sị na ọdịnihu ya kwesịrị ka o chukarịa unu ụra karịa mụ onwe m. Nke mbụ bụ na ọ bụ otu n’ime ụmu unu nke agamnihu ya bụ unu ga-eri uru ya; Chike ọkamgba kwuru sị “Nke a bụ eziokwu.” Chike gakwara n’ihu sị, nke a bụ ihe m na-ekwu mgbe niile; A na- agụ Ọhịa ka otu n’ime obodo nwere ọkamgba a ma ama. Ọ bụrụ na anọghị m ebe a, o nwere onye ọ bụla ga-echeta Ọhịa?”\nMaazị Ọkafọ kwuru gawa sị abịara m ka m hụ unu n’ihi na nwata nwoke ahụ nọ na nsogbu; Agụ ji agbara ndị nna nna ha ṅuọ iyi dị ka ọ chọpụtara na nne Eze na-ekpesara onye nkuzi ahụ ihe niile. Ọ sị, “m ga-eti nwaanyị ahụ ịchaka ma ọ bụrụ na ọ na-eche na ọ ga-akọtọ aha anyị n’efu!”\nNwoke isiọcha ahụ bụ Chike bidoro sị ya ”I kwesịghị ịmanye nwoke na- ekwu okwu aka n’ọnụ, ọ bụ agwa ọjọọ, gawa n’ihu biko onye nkuzi.” Maazị Ọkafọ kelere ya. Nsogbu ya abụghị ihe ga-eme unu ihere. Ọ bụ nwata nwoke maara akwụkwọ. Ọ na-arụsi ọrụ ike, nwee nrubeisi ma na-asọpụrụ mmadụ. Nsogbu ya bụ na o nweghị ego ọ ga-eji kwụ ụgwọ akwụkwọ ya. Ana m eche na o nweela otu ihe o meere onye ọ bụla n’ime unu na-agbanyeghị otu ihe ahụ si pe mpe. O kewapụbeghị onwe ya n’ụzọ ụnu si ebi ndu. Ọ bụkwa otu onye n’ime unu. Ọ bụ nwa unu nwoke. Ọ chọrọ enyemaaka ka o wee nwee ike kwụọ ụgwọ akwụkwọ ya. Ọ gwụla. Ha gbara nkịtị ogologo oge ka o kwuchara okwu, ya mere, Bosa sịrị: “o nweghị mgbe ọ bụ anyị na-ahụ maka akwụkwọ ọ na-agụ, ọ bụrụ na ego ọ ga-eji kwụ ụgwọ akwụkwọ adịghị, ya kwụsị akwụkwọ. Kedụ ka anyị ga-esi bu ibu akwụkwọ ya ugbu a?”\nMaazi Ọkafọ chetaara ha na ọ bụ ọchịchọ nna ya na ọ ga-eje akwụkwọ.\nKedụ ka nna ya ga-esi were ọrụ dịịrị ya nye anyị. Ọ bụrụ na ọ chọro ka e gbue ụmụ anyị niile, ị ga-akwado ya? “Nna ya enweghị ihe ọ bụla ọ chọrọ.” Agụ kwuru na mwute sị “nwaanyị ahụ bụ nwunye ya konukọrọ ihe niile a.” Ọ bụ asị’.\n“Mba, ọ bụghị asị; Maazị Ọkafọ jiri nwayọo kwuo kwusịe nke a ike, Ọ gwara m tupu ọ nwụọ na ọ chọrọ ka Eze gaa n’ihu n’ịga akwụkwọ ya karịchaa ihe ọzọ’.\nHa nụrụ ihe o kwuru ma ha ekwughị okwu ọ bụla. Ya mere otu onye n’ime ha sịrị, “ọ bụrụ na ịgụ akwụkwọ bụ ezi ihe, agaara m enye aka. Mana ọ na-ekewapụ mmadụ n’ụzọ ha si ebi ndụ. Ọ naghị akụziri nwata nwoke otu e si akọ ji. Mgbe ha rụrịtara ụka ọtụtụ oge, Chike gwara Maazị Ọkafọ ka o nyetụ ha ohere; agatala aka, n’ihi na echeghị m na anyị ga-anọ ọdụ.\nMaazị Ọkafọ hapụrụ ha, jee ịhụ Eze na nne ya wee gwa ha okwu ya na ndị okenye Ọhịa ji n’aka.\nKa Eze na nne ya na-anụrụ ihe Maazị Ọkafọ na-ekwu, ndị okenye Ọhịa na agadi Chike nọ na-agbaghasị, na-eche ka Maazị Ọkafọ rue ebe ọ gaghị anụ ihe ha ga-ekwu tupu ha agawakwa n’ihu na nzukọ.\nUnu anụla arịrịọ gbara gharịị onye nkuzi bịara rịọ. Ọ bụ ihe gbara gharịị n’ihi na o sonyeghị n’ụzọ anyị si eme ihe. Otuosiladị, n’oge nke m, ahụla m ọtụtụ nnukwu ihe mgbanwe ma o doro m anya na mgbanwe ọzọ nwere ike wetakwa obere ihe dị iche ma ọ bụkwanụ ewetaghị ndịiche ọ bụla. Gịnị ka unu na-eche?\nBosa bụ onye ọzọ kwuru okwu. Ọ sị, ekwenyeghị m na anyị ga-akwụrụ Eze ụgwọ akwụkwọ. Ọ bụ ezigbo nwata nwoke, amaara m nke a, mana ọtụtụ n’ime anyị enweghị ihe anyị ga-eme iji nyere ya aka. N’ịma atụ, mụ onwe m nwere ụmụaka iri na ndị nwunye atọ. Ekwesịrị m inye ha niile nri na uwe. Nke ọzọ, afọ a bụ afọ ọjọọ, ndị nwunye m enweghị uru ọ bụla ha nwetara n’ihe ndị ha rere n’ahịa Ama. Okpomoọkụ na-emebisi ji dị n’ọba m. Kedụ ka m ga-esi tụkwasịkwa ibu ịkwụrụ nwata nwoke na-enweghị otu mụ na ya siri metụta ụgwọ akwụkwọ?\nỌ bụ ezie na anyị ajụghị ego ole ụgwọ akwụkwọ ya bụ, Aso nwoke ahụ dị nganga toro ogologo kwuru sị “o doro m anya na ego ole ọ bụla ọ dị na ọ bụrụ na anyị niile kee ya, ọ gaghị abụrụ anyị ibu arọ. Ka anyị kpọọ Maazị Ọkafọ ma chọpụta ego ole ụgwọ akwụkwọ ahụ bụ. Ọkamgba Achike kwuru sị “Ha bụ shịlịn iri atọ na abụọ maka ọtụ taam. Maazị Ọkafọ gwara m?”\nAso gaara n’ihu kwuo, sị “ọ bụrụ na anyị asatọ nọ ebe a kee ya, ọ bụ naanị shellin anọ ka otu onye ga-akwụ otu taam. Echeghị m na nke ahụ bụụrụ anyị nnukwu ibu.” O teela m bubere ibu ndị mmadụ. Agụ kwuru Dị ka afọ ya na ayọgharị. “Agaghị m emekwa ya ọzọ?” Gịnị kpatara gị na Iwe jiri mefusịa ihe Okonkwọ nwere n’akwamoozu ya? Ma Chike kwuru sị, ọ bụ unu abụọ mebiri ezinaụlọ ya.”\n“Onye gwara gị na anyị mere nkea? Anọ m ebe ahụ mgbe nwunye ya gwara gi ka i hapụ ihe ụfodụ maka iji zụ nwa ya n’akwụkwọ mana ị jụrụ ajụ. N’echi ya, Iwe buru ihe jee tọkọrọ ji niile dị n’ọba ha gbukwaa ewu ha niile.”\nỌ ka mma inye onye nke gị nwụrụ anwụ akwamoozu dara ụda karịsịa onye nwụrụ ka dike; Agụ kwuru nke a Dị ka ihe dị oke mkpa.\nChike jụrụ sị, ọ ka mma imefusi nri n’onye nwụrụ anwụ ma hapụ ndị dị ndụ n’agụụ.\nOnye mere gị onye nkwupute ọnụ ha? Agụ jụrụ ya. Ọ bụ n’ihi na ha enweghị onye ga-ekwuchitere ha ọnụ ka unu jiri chọọ ka agụụ gugbue ha? Iwe kwuru, “mana onye nkuzi ekwughi na agụụ na-agụ ha. O kwuru na ha enweghị ego iji kwụ ụgwọ akwụkwọ. Nke a bu okwu a kpụ n’ọnụ.”\nHa gara n’ihu n’ịgbaghasị n’olu ike na-ekwusikwa ya ike. Ihe ka n’ọnụọgụgụ kwuru na ha agaghị atụkọ ego maka ụgwọ akwụkwọ Eze n’ihi na áfọ̀ jọrọ njọ maka na ha nwere ụmụ na ndị nwunye ha na-elekọta anya; nke ọzọ na ihe gbasara Eze abụghị ha ka ọ dịịrị. Mgbe o doro anya ihe mkpebi ha bụ, agadi Chike kwuru okwu ọzọ.\n“Ọ bụ ihe ebere na unu kpebiri ịjụ inyere nwata a bụ Eze aka. Ọ bụrụ na ahụ ka siri m ike na m na-arụkwa ọrụ, a gaara m enyere ya aka. Ahụla m ọtụtụ ihe mgbanwe n’oge nke m ma ọtụtụ ka na-abịakwa. Unu na-ajụ ya ugbu a n’ihi na o nweghị nna, na n’ihi na nne ya bụ ogbenye. Unu maara ihe ọ ga-abụ echi? Unu anaghị eso ụkpụrụ nna unu ha. Ha agaghị ajụ nwa a Dị ka unu na-eme. Ma site n’amara Chineke ọ ga-adị ndụ werekwa iko unu ji manye ya manyekwa unu.\nE zipụrụ otu onye ịga gwa Maazị Ọkafọ mkpebi ndị okenye. Ọnụma juru Maazị Ọkafọ obi nke mere na o were iwe laa.", "N’ezie, afọ ahụ bụ afọ ọjọọ n’Ọhịa. Ma n’ebe Eze nọ, ọ kaara ya njọ. Mgbe ndị okenye jụchara arịrịọ Maazị Ọkafọ rịọrọ, ọ dị Eze ka o nweghị ike ijekwa akwụkwọ ọzọ, ọ bụ ezie na tutu Maazị Ọkafọ ahapụ Ọhịa, ọ gwara ya na nne ya na ya ga-eme ihe niile o nwere ike ime iji nyere ha aka.\nỌjụjụ ha jụrụ mere Eze ka o cheta ihe mgbu ahụ dị n’ihu nna ya mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ na ajọ mmerụ ahụ nke agụ ahụ merụrụ ya. Ihe ikpeazụ o kwuru bụ na Eze ga-aga n’ihu ịgụ akwụkwọ ya o peketa mpe ya gurue ebe ọ ga-enwe ike ideli ihe. O chetara ahụ rịarịa nne ya na mbọ ọ gbara ịhụ na nne ya gbakere ngwa ngwa. O chetara ihe isiike niile mara ya aka n’ihu na okwu nkwugide niile ya na nne ya gabigara n’ihi na nna ya anọghị ndụ.\nIhe na-egbukarị ya mgbu ugbua bụ otu ụmụ nne nna ya siri mefusia ihe nna ya na mmemme akwamoozu mgbe nna ya nwụrụ, na otu ha siri were ego di Ụlụ nyere ya na nne ya. Ihe ndịa na-eme ya ka ọ na-ebe akwa n’abalị.\nOtu ụtụtụ, Dị ka ọ no na-arụ ọrụ dịịrị ya n’ezi na ụlọ, ọ malitere ichemi echiche ime. Ọ gịnị mere? Kedụ otu m ga-esi nweta ụgwọ akwụkwọ m? Ihe gara aga agaala ma o nweghịkwa ihe a ga-eme ya; N’ezie, a ga-enwerịrị ụzọ mgbapụ n’ọdịnihu?\nDị ka ọ na-eche , olu abụọ malitere ikwu n’ime ya. Nke mbụ sịrị jee zuru ihe na nke ndị agbataobi unu, n’ihi na ọ bụ ha mefusiri ihe nna gi. Ọ bụ ha ji pound iri anọ ahụ i nwere oke n’ime ya. Ọ bụrụ na i zuru ụgwọ akwụkwọ gị na nke ha, o nweghị ihe ọjọọ ị na-eme ọ bụ naanị ihe bụ nke gị ka ị na-ewere.\nOlu nke abuọ sịrị; mba, ọ bụ ihe ọjọọ izu ohi; Nke ọzọ, ọ bụrụ na ha jide gị, ha ga-ete gị ntụ, konye gị iberibe eju na ogbugba n’olu ma dugharịa gị, ịgbara egwu gaa obodo niile, a na-akụrụ gị ịgba na aka. Ị chọrọ ụdị ihe dị otu a?\nOlu nke mbụ kwuru sị, ọ bụrụ na izughị ohi, ị ga-akwụsị ije akwụkwọ. Ọ bụrụ ndị be unu meriri n’ikpe azụ’ Tulee ihere ị ga-agabiga ma ọ bụrụ na e jide gị; olu nke abụọ jị nwayọọ ma na-akwagide ya. Tulee ihe ihere ọ ga-ewetara nwa nne gị nwaanyị na nne gị. Ọ ga-egbu nne gị mana ị ga-ejerịrị akwụkwọ, bụ ihe olu nke mbụ gwakwara ya ngwa ngwa. Ego ahụ dị n’ụlọ Iwe mana o nweghị onye ọ bụla nọ ebe ahụ, gaa chọọ ya ugbụa.\nOlu nke abụọ chigharịrị gwa olu nke mbụ; ‘Enyezịla ya ndụmọdụ ọjọọ.\nMgbe niile ị na-achọ ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ.\nỌ bụrụ na ihe m kwuru dị njọ, gwa ya ụzọ ọ ga-esi nweta ego ụgwọ akwụkwọ ya. Olu nke mbụ kwuru nke a n’iwe. ‘Egela ya ntị; olu nke abụọ dụrụ Eze ọdụ. Ọ hụrụ ihe ọjọọ n’anya. Mgbe ị nọ na nsogbu, kpeere Chineke. Ọ hụrụ ụmụ aka n’anya, ọ ga-enyere gị aka.\nEze chetara ebe Maazị Ọkafọ gụụrụ ha otu oge ‘Rịọ, unu ga-arịọta. Ọ gbaba n’ime ụlọ. Ọ bụ ezie na nne ya na-akpọ ya ka o rie nri ụtụtụ, ma o sekpuuru ala, mechie anya ya, makọọ aka ya abụọ, ma kpesie ekpere ike ngwa ngwa n’ụdị o kpebeghị mbụ.\nỌ sị, Chineke, “ana m ata ahụhụ hinne. Enweghị m ego iji kwụ ụgwọ akwụkwọ. Ndị be anyị nwere ego, mana ha achọghị inyere m aka.\nNne m bụ ọgbenye, o nweghị ike inyere m aka. Ọ bụ naanị gị nwere ike inyere m aka. Biko, Chineke, nyere m aka ka m wee nwee ike gụchaa akwụkwọ m Amen!”\nO guzoro ọtọ ma nwee obi añụrị. Mana o nweghị ihe ọ bụla mere iji nyere Eze aka. Ọ bụ mgbe ọ fọdụrụ mkpụrụ ụbọchị abụọ ka akwụkwọ bido ọzọ, ka nwoke ogologo afụọnụ ọcha ahụ bụ Chike kpọrọ Eze, kpọrọ ya baa n’ime ụlọ ya ma mechie ụzọ. Site n’ite o liri n’ime ala okpuru akwa ọ gbara ute, ka o wepụtara akwụkwọ ego shillin iri. O kwuru sị “were nkea” Ọ bụ naanị ihe m nwere. Si ebe ọzọ chọta ka i wee mezue ụgwọ akwụkwọ gị. Chukwu gọzie gị nwa m’.\nEze nwere obi aṅụrị. Anya mmiri oñụ jupụtara ya anya, n’ịtụ Chike n’anya ọ makụọ ya ma susuo ya ọnụ n’egedege ihu. Eze gwara agadi nwoke ahụ na-achị ọchị mgbe o nwere ọnụ okwu sị, Nna m ukwu, Chineke ga- akwụghachi gị. A gwakwala onye ọ bụla ọzọ naanị nne gi na onye nkuzi gị otu i siri nweta ego ahụ, mmadụ abụọ ndị ahụ agaghị eche na izutere ya ezute’\nNne Eze ejeela ahịa Dị ka o si eme. Mgbe ọ lọtara ahịa, Eze gwara ya ihe agadi Chike nyere ya, o biliri ozigbo gawa ikele ya. Mgbe ọ lọghachiri, otu nwaanyị bịara ịriọrọ ha obere ite ọna ka o wee siere nwa ya nwoke ezigbo nri n’ihi na o si Ọnịcha bịa ileta ha. Ite ọna ahụ dị n’ime ụlọ nke bụ ụlọ nna Eze.\nO nwebeghị ihe e ji ite ahụ mee ihe Dị ka afọ abụọ gara aga. Mgbe nne Eze gara ibute ite ahu, ọ nyịrị arọ karịa ka o kwesịrị. Nke a mere na ọ dọbara ya n’ala wee kwughee ya. Kịrịkịrị ego fọrọ obere ka o ju ya. O lelere ha ma chọpụta na ha bụ ezigbo ego. Ọ wụsara ha niile n’ala ma buru ite nkịtị pụta n’ime ụlọ ahụ. Mgbe nwaanyị ahụ lara, nne Eze laghachiri ma gụkọọ ego ahụ. Ihe ego niile ahụ dị bụ shellin iri abuọ na otu. Ọ kpọrọ Eze gosi ya ego ahụ.\nUgbua, a ga-akwụ ụgwọ akwụkwọ gị, nwa m. Chineke anụla ekpere anyị n’ihi na tinyere shillin iri nke agadi Chike nyere gị na ego a, ọ bụ naani otu shellin ka ọ fọdụrụ nke m nwere ike inye gị site n’ego m retara n’ahịa.\nN’abalị ahụ, Eze tinyere uwe akwụkwọ ya n’okpuru ihe o ji ehiri isi ka o wee dị ka ihe e dere ede. N’ụtụtụ echi, o were ụgwọ akwụkwọ ya wee jewe Ama. Ihe mbụ Maazị Ọkafọ mere n’ụtụtụ ahụ bụ ịnabata ụmụ akwụkwọ bịara akwụkwọ, ndị niile mere nke ọma n’ule ka o tinyere na klaasị ọzọ ma doziere ha otu ha ga-esi nọ. Ugbua Eze anọdụla na Standadị II. E zitela obere onye nkuzi n’ụlọ akwụkwọ dị n’Ama. Maazị Okafọ kọwaara ụmụ akwụkwọ onye ọ bụ ma tinye ya ilekọta klaasị ndị ọtaakara, ya onwe ya nweziri naanị ndị Standadị I na II ọ ga na-akụziri.\nỌsịsọọ na-esu Eze na nne ya site n’ịrụsi ọrụ ike, ma tupu taam nke abụọ erue, ha enwetala ego a ga-eji kwụrụ ya ụgwọ akwụkwọ. Mana nkea gachaa, Eze ejighị n’aka ebe ego ụgwọ akwụkwọ nke taam na-abịa ga-esi bịa.\nNdị Obodo Ama, Ọhịa na obodo ndị ọzọ dị ha gburugburu na-abịakwute Maazị Ọkafọ ka o deere ha leta maka ndị nke ha nọ mpaghara obodo dị iche iche. Ọ na-edere ha opekata mpe leta iri na ise n’otu izuuka. ọ bụ na mmmalite taam ka otu ihe gbatara Maazị Okafọ n’uche. Ọtụtụ ndị mmadụ na-edegara ndị be ha nọ n’amị na-agwa ha ka ha lọta ụlọ ngwa ngwa. Maazị Ọkafọ enweghị ike idechara ha niile leta ahụ, ya mere ọ gwara Eze ka ọ na-abịa akwụkwọ ụbọchị satọdee ka ọ na-edere onye ọ bụla chọrọ leta leta. Na mbụ, ndị mmadụ na-achị ọchị mgbe Maazị Ọkafọ gwara ha na ọ bụ obere Eze ga-edere ha leta ahụ. Mana Maazị Ọkafọ bụ nwoke maara ihe. Ọ chọrọ igosi ha na Eze ga-enwe ike idere ha ihe ọ bụla ha kwuru. Ya mere o ji mee ka Eze na-ede leta ndị ahụ n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe o dechara leta ọ bụla, onye nwe ya na-ewere ya gaa n’ụlọ Maazị Ọkafọ. N’ebe ahụ ka Maazị Ọkafọ ga-agụ ihe ahụ Eze dere. Ndị ahụ ga-ahụ na o dere ihe ha kwuru n’otu n’otu - ahirịokwu ọ bụla, ma mkpu e tigasịrị, atụmatụokwu na ilu dị iche iche. Mgbe adịghị anya, o doro ha anya na ọ na-ede ọfụma, ebe ụfọdụ sị na ọ na-edekwa ka Maazị Ọkafọ n’onwe ya si ede.\nMgbe izuụka nke mbụ gachara, Maazị Ọkafọ si Obodo weta akwụkwọ e ji ede leta, stampụ na nfelop. Ọ gwara ndị mmadụ na ha ga na-akwụ penny isii maka leta ọ bụla edere ka o wee nọchite anya ihe e ji de leta na ọrụ dị n’ide leta ọ bụla. Maazị Ọkafọ na-eke uru si n’ime ya apụta n’etiti ya na Eze. Ọ naghị enye Eze ego ndị ahụ kama ọ na-agwa ya ka ọ na-edetu leta ole o dere n’izu ụka ọ bụla.\nMgbe oge ịkwụ ụgwọ akwukwọ gị ruru; anyị ga-ewere peni abụọ a na- enweta n’otu leta wee mata ole a ga-enweta nke ga-enye aka maka ụgwọ akwụkwọ gị. Eze kwere ya, ‘oo nnam ukwu n’obi aṅụrị. Mgbe ndị mmadụ bidoro gbasawa akụkọ na a na-edere ha leta ha otu ha chọrọ, ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa ka ha hụ nwata nwoke ahụ dị egwu ma nwalekwa ya. N’izu ụka iri na otu tupu akwụkwọ emechie n’Ọgọst; Eze enwetala ihe karịrị otu pound. Tupu mgbe ahụ, mmiri amalitela izo ọzọ, Eze kọrọ ugbo ya Dị ka ọ na-eme n’afọ ndị ọzọ ụfọdụ ego ọ na-enweta n’ugbo ya ka o ji emeju ego ụgwọ akwụkwọ ya ebe ọ na-enye nne ya nke fọdụrụ maka nri ha. Otu a ka Eze siri hụ na ya nwere ike ịkwụ ụgwọ akwụkwọ taam ikpe azụ ya mgbe akwụkwọ malitere.", "Otu ụtụtụ ụbọchị Mọnde, mgbe a lọtachara ezumike Ọgọst, Maazị Ọkafọ gwara ụmụ akwukwọ sị “onye nlekọta agụmaakwụkwọ bụ Maazị Thomson ga- abịa n’ụlọ akwụkwọ dị n’Ama. Onye nlekọta agụmakwụkwo a bụ onye ọcha. Ọ na-abịa ile ndị nọ na klaasị dị elu ule nke ha ga-eji ba n’ụlọ akwụkwọ Sentral dị n’Obodo. Nke ahụ gachaa, ọ bụrụ na igusie akwụkwọ ike, i nwekwara ike ije n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị. N’ebe ahụ ka ị ga-amụta ọtụtụ ihe.” E mechaa, ọ gwara ndị Standadị II okwu. Ọ bụ unu bụ ndị ule a gbasara kpọmkwem, unu ga-agụsi akwụkwọ ike ka unu wee gafee n’ihi na e nwere ụlọ akwukwọ iri ndị ọzọ ọ ga-eji otu ule ahụ letakwa. Ọ bụ ụmụ akwụkwọ iri atọ mekarịchara nkeọma n’ụlọ akwụkwọ ndị a ka a ga-ewere. Ya mere unu ga-agụsi akwụkwọ ike ka unu wee mee ihe ga-atọ ya ụtọ ma mee ka oge na ike m na-etinye n’ịkụziri unu ghara ịbụ ihe efu ma mekwa ka nne na nna unu mata na ego ha na-etinye n’isi unu abụghị ihe lara n’iyi.”\nN’izu ahụ, ụmụ akwụkwọ ahụ gụsiri akwụkwọ ike. Ha na-agụrụ akwụkwọ ruo n’ime abalị n’ihi na ọdịnihu ha dabeere n’ule ahụ. N’ụbọchị Fraịdee, ha kpochasịrị ụlọ akwụkwọ n’ihi na akwụkwọ agaghị adị na satọdee na ụbọchị ụka.\nNa mgbede ụbochi ụka, onye nlekọta agụmakwụkwọ ahụ jiri ụgbọala ya bịa n’Ama. ọ rahụrụ n’ụlọ ezumike nke a rụchara ọhụrụ. N’ụtụtụ, ụmụ akwụkwọ bịara akwụkwọ n’oge. Mgbịrịgba kụrụ, ha niile kwụrụ n’ahịrị ebe Maazị Ọkafọ bịara lelee ha. Ha fere aka gagharịa n’obere ebe ha na-egwuri egwu wee baa n’ụlọ akwụkwọ ha Dị ka ọ na-agụrụ ha, akaekpe, akanri, akaekpe akanri. Ha kpere ekpere ma bụkwa abụ. A kpọrọ ha aha ma kanyechaara ndị bịara. Ihe ọmụmụ nke mbụ ụbọchị ahụ bụ ihe gbasara akwụkwọ nsọ malitere. Mgbe ha mechara nke a ma na-eweghachi akwụkwọ nsọ ha ka onye nlekọta agụmagụakwụkwọ ahụ batara. Umụ akwụkwọ niile kwụrụ ọtọ wee kelee ya ‘Ndeewo, nna anyị ukwu’.\nIhe Maazị Thomson hụrụ juru ya afọ mana ọ bụghị mmadụ na-egbu oge n’ihe enweghị isi. Ndeewo nụ, unu niile, nọdụ ala. O chigharịa n’ebe Maazị Ọkafọ nọ sị, Ama m na ị gwara ha ihe kpatara m jiri bịa. Aga m amalite ozigbo n’ihi na enwere m ụlọ akwukwọ abụọ ndị ọzọ m ga-eje taa ma ha abụọ techara aka n’ebe ibe ha dị.\nO chigharịrị na klaasị ma gwa ha okwu n’asusu ụmụ aka ahụ ọ bụ ezie na ọ naghị ekwucha ihe ha na-aghọta mana o juru ụmụ aka ahụ anya na onye ọcha nwere ike ịsụ asụsụ ha.\nYa mere, o dere ajụjụ gbasara mgbakọ na mwepụ n’ugboojii. Ụmụnwoke ahụ dechara ihe ndị ahụ tutu oge ezuo. Oge niile, onye ọ bụla n’ime ha na- agụgharị ihe ọ na-ede na ihe o nwetara. Maazị Ọkafọ kuziiri ha ka ha ghara isi n’ebe a na-ele ule pụọ tupu oge ezue. N’oge a na-ele ule niile ahụ, ụmụ akwụkwọ si n’ụlọ akwụkwọ dị n’Ama mere ihe tọrọ Maazị Thomson ụtọ. Ha niile dere Asụsụ Bekee ede na nke a jụrụ ha n’ọnụ, ajụjụ ọzọ bụ n’ a kpọọ e dee, tinyere nke ikpe azụ bụ ịgụpụta ihe n’asụsụ nke ha.\nMgbe e lechara ule ndịa, Maazị Thomson buru ụgbọala ya gaa n’ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ wee lọghachi n’Ama. E mechaa ya na Maazị Ọkafọ were igwe gaa n’obodo dị iche iche ịhụ ndị okenye ha.\nMgbe ha na-aga Ọhịa Maazị Ọkafọ kọọrọ Maazị Thomson nsogbu Eze, o wee kwe nkwa ịgwa ndị okenye maka ya. Ndị okenye ji obi añụrị nabata ya, n’ihi na ọtụtụ n’ime ha ahụbeghị onyeọcha mbụ. N’ihi nke a, Maazị Thomson bụụrụ ha ihe nlele. Mgbe Maazị Ọkafọ gwara ha na o nwere ụlọ nweere ụkwụ anọ a na-akpọ ụgbọala, ha niile siri na ha ga-abịa ịhụ ya n’ụtụtụ echi.\nMaazị Thomson gwara ndị okenye okwu maka Eze. Ọ gwa ha n’asụsụ ha sị “unu nwere ike ịnụla na abịara m ilele ụmụ unu akwụkwọ maka ịba nnukwu ụlọ akwụkwọ dị n’Obodo. Ọ jụkwa ha sị ụmụ aka ole si n’obodo a eje akwụkwọ? Maazị Ọkafọ zaa sị ‘Ọ bụ naanị otu onye, Eze Adị.”\nNke a juru Maazị Thomson anya “Naanị otu onye” maka gịnị? Ejeela m obodo ndị ọzọ dị gburugburu ebe a, na nke ọ bụla n’ime ha, e nwere opekata mpe mmadụ anọ nọ n’ụlọ akwụkwọ. Gịni mere na unu na-alaghachi azụ?\nOtu okenye zara sị nne na nna anyị ejeghị akwụkwọ mana ha biri n’obi añụrị, ‘oge ndị ahụ agaala;” ka Maazị Thomson kwuru n’iwe. Unu kwesịrị ịdị na-aga n’ihu ka ndị agbataobi unu. Ọ bụ ndị be unu ndị maara uru agụmakwụkwọ bara bụ ndị rịọrọ ka e webata ulọ akwụkwọ ma unu na-agwa m na unu nwere naanị otu nwata nwoke n’ebe ahụ.”\nMana mgbe ha niile jebere akwụkwọ, ihe ọ ga-apụta bụ na ọ bu mmadụ ole na ole ga-afọdụ ịrụ ọrụ n’ugbo anyị, bụ ihe okenye ọzọ kwuru.\nO nwere ike ịbụ mana unu amaghị na ihe e ji arụ ọrụ ka mma ka a na- akuzizi ugbu a. E nwere igwe nke nwere ike ịkọ ugbo niile unu n’otu oge taa. Igwe ndị a nwere ike ịkọri ala, kụọ mkpụrụ ma ghọọ mkpụrụ ndị ahụ.\nHa kwuru na nke a abụghị eziokwu, gosipụtakwa ya n’ihu ha.\nUnu echeghị otu ahụ? “ọ bụrụ na unu kwenyere ihe Maazị Ọkafọ gwara unu gbasara ụlọ m nwere ụkwụ anọ, unu ga-makwa na m na-ekwu eziokwu.” Agụ gwara ya sị, Anyị ekwenyeghị n’ihe i kwuru. Ihe anyị kwuru bụ na anyị ga-abịa hụ ya.\n‘Gịnị mere na I jighi ụlọ gị ahụ bịa n’Ọhịa? Iwe jụrụ ajụjụ nzuzu a.\nMaazị Thomson zara sị, ọ bụ n’ihi na e nweghị ụzọ ọ ga-esi ga.\nMaazị Ọkafọ kwutere ihe ọzọ. Egwu dịkwa n’ihi na Eze ga-akwụsị akwụkwọ maka na nna ya nwụrụ anwụ. Nne ya bụ ogbenye, ma ọ dighị onye ọ bụla chọrọ inyere ya aka. Arịrịọ m ndị a, mana ha ekweghị.\nMaazị Thomson kwuru sị, nke a bụ ihe jọgburu onwe ya. Unu amaghị ihe na-efunahụ unu. Chee ka m gwa unu, obodo unu na-agbanwe ma na- agbanwekwa n’ike n’ike. Naanị ma unu sonyere na mgbanwe a ugbua, ụbọchi na-abịa mgbe unu ga-echeta okwu m na mwute n’ihi nzuzu unu. Ọ kwụsịtụ. Enwere m ike ịkwụrụ ya ụgwọ akwụkwọ mana agaghị m eme ya n’ihi na nke a bụ ọrụ dịịrị unu.\nNgwa ngwa Maazị Thomson na Maazị Ọkafọ lasịrị, onye oje ozi wetara agadi Chike leta ma sị ya na a ga-eweghachi ụsa leta ahụ echi na nke nwa D.C. Ndị okenye ahụ agbasabeghị mgbe e wetara leta ahụ. Onyeozi ahụ amaghị agụ mana ọ gwara ha na a chọrọ ụsa ya ngwa ngwa. Onye nwere ike ịgụ ya? A kpọrọ Eze, mana o nweghị ike ịghọta ya n’ihi na ọtụtụ okwu dị na ya, ha emebeghị ya n’ụlọ akwụkwọ. Ya mere ndị okenye kpebiri ichere ka ha gosi ya Maazị Thomson n’ụtụtụ.\nN’ọnụ ụtụtụ echi ya ha nọ n’ụlọ akwụkwọ dị n’Ama. Ọtụtụ ndị ọzọ sikwa n’obodo ndị ọzọ bịara ebe ahụ ka ha hụ Maazị Thomson. Maazị Ọkafọ nabatara ha. Ọ gbasara ute ụmụ akwụkwọ n’ime ụlọ akwụkwọ, ebe mmadụ niile nọdụrụ ala. Ndị enweghị ike ịhụ ohere n’ute ahụ nọdụrụ ala n’obere aja ngwe ụlọakwụkwọ. Ụmụ nwoke ndị Ọhịa enweghị ike ịba n’ime. Ha nọgidere na mpụta rue mgbe Maazị Ọkafọ siri n’ime ụlọ akwụkwọ pụta.\nAnyị natara leta a ụnyaahụ mgbe unu lara. Eze enweghị ike ịgụ ya, anyị wee wetara gị ya.\nMaazị Ọkafọ naara ha leta ahụ. Ọ sị, n’ezie, amaara m na ọ ga-esiri Eze ike ịgụ mana ọ bụrụ na ọ nọkwuo afọ atọ ma ọ bụ anọ ọzọ n’ụlọ akwụkwọ a ọ ga-enwe ike ịgụ ya. Dị ka ọ na-ekwu, o mepee akwụkwọ ahụ o ji n’aka, gụọ. O wee malite ịkọwa.\nNke a na-ekwu maka ego ụtụisi unu ga-akwụ ọ bụ okpukpu atọ ihe unu kwụrụ n’afọ gara aga. Ụfọdụ n’ime ha tiri mkpu sị, Awuu!\n‘Ewo!’ ka ndị ọzọ tikwara. Nke a ga-egbu anyị’ Mgbe ahụ Maazị Thomson bịara n’ime ụlọ akwụkwọ. Ha kelere ya, ma na-egbughị oge, otu nwoke biliri ma kwue sị, onye ọcha, ndị be anyị kwuru na anyị ga-eziga ụmụ anyị niile akwụkwọ mana ụlọ a pere mpe, unu nwere ike ime ya ka o bukarịa? ‘Ee, ma ọ bụrụ na ndị obodo niile ga-ekwe iziga ụmụ ha niile akwụkwọ ma mekwaa ya emee.\nNwoke ọzọ kwuru sị, “Anyị ka na-eche ihe niile ị gwara anyị na be anyị ụnyaahụ. Anyị ga-enye Maazị Ọkafọ ụsa anyị; n’ihi na eze anyị anọghị n’obodo anyị enweghị ike ikpebi ihe ọ bụla n’azụ ya.\n‘Nke a bụ eziokwu’\nOnye nke atọ kwuru sị, ụnyaahụ mgbe unu lara, e wetaara anyị leta gwa anyị na anyị ga-akwụ okpukpo atọ n’ụtụisi anyị kwụrụ afọ gara aga.\nỤdị ahụ kwa ka e ziteere anyị bụ ihe ndị ọzọ kwuru Dị ka ha na-egosi akwụkwọ e ziteere ha n’obodo ha. Nwoke nke atọ kwuru sị anyị ekpebiela ịrịọ ndụmọdụ unu.\nNdụmọdụ m bụ ka unu ziga ụmụ unu akwụkwọ. Maazị Thomson kpachara anya kwue nke a. Ọ gaghị ete aka ụmụ unu ga-amata mgbe onye ọ bụla chọrọ ka ọ ghọgbue unu, ha ga-asị, mba’ n’ihi na ha ga-aghọta ihe bụ uche ndị ziteere unu leta ahụ.\nOtu nwoke chọrọ ka ọ mata ihe e ji ego ha na-akwụ kwa afọ eme. Maazị Thomson kọwara na ego ndị ahụ bụ maka ịkwụ ndị uwe ojii ụgwọ, ịrụ ụzọ, akwa mmiri, post ọfiisi na ihe ndị ọzọ.\nOnye ọzọ kwuru sị, mana anyị enweghị ihe ndịa n’ebea, ọ bụ ezie na anyị akwụtala ọtụtụ ego n’afọ ndị gara aga.\nỌ bụ ya kpatara m ji sị unu ziga ụmụ unu akwụkwọ n’ihi na oge na- adịghị anya na ha ga-ahụ na unu nwetara ihe ndị a.\nNdị ahụ si Ọhịa nọ n’ezi gbara nkịtị na-ege ihe niile a na-ekwu. Ha na- atụle ụsa niile Maazị Thomson nyere site n’ajụjụ ndị si n’obodo ndị ọzọ jụrụ.\nMgbe nzukọ ahụ gbasara, Maazị Thomson nyara ụgbọala ya si n’ọnọdụ ụgbọala ya puọ. Ndị mmadụ na-ele ụgbọala a na mgbagwoju anya. Ọ nyagharịrị ya ugbo abụọ n’ama egwuregwu. Nke ugbo atọ, o rue nso ebe ndị Ọhịa nọ ma sị ha, ugbu a unu ekwerela na ihe m gwara unu bụ eziokwu?\nNdị okenye nọ na-atule n’ụzọ mgbe ha na-ala ma ha emere nke ọma ịjụ ịkwụrụ Eze ụgwọ akwụkwọ. Mana tupu ha ruo Ọhịa, ha echefuola ihe niile gbasara Eze.", "E wepụtara rịzọọltụ ule ahụ onye nlekọta agụmakwụkwọ bịara lee ụmụaka. Atọ n’ime mmadụ ise bu ụzọ bụ ụmụ akwụkwọ Maazị Ọkafọ, Eze so n’otu n’ime ndị mere nke ọma. Ọ gwara nne ya, ma ọ bụ ezie na o nweghị onye ọzọ ha gwara, mgbe adịghị anya obodo niile anụla ya. Onye ọ bụla na-ekele ya mana o nweghị onye ọ bụla chere echiche maka ịkwụrụ ya ụgwọ akwụkwọ.\nMgbe ha nọ n’oge ezumike Maazị Ọkafọ bịara ịhụ Eze na nne ya mana Eze gara ileta ọnya o kweere oke ọhịa.\nMgbe onye nkuzi ahụ na-achọ ịhapu Ọhịa, ọ jụrụ nne Eze ma ọ ga-ekwe ka nwa ya jee biri n’Ama.\nNne Eze jụrụ sị “Ya na onye?” Maazị Okafọ kwuru sị “Nke ahụ abụghị ihe na-eche m. Eze na-abara gị ezigbo uru. Ọ na-ekutere gị mmiri na-akpatara gị nkụ, ọ na-esiri gị nri ma ọ bụrụ na i jewe ahịa. Ọ bụ ya na-asụchasị akwa, na- ejegasịri gị ozi, ọ na-eme gị onye abụọ. Ọ bụrụ na ọ pụọ, ọ bụ naanị gị ga na- arụzị ọru niile.\nO jiri nwayọọ zaa sị, o nweghị aja m na-agaghị achụ maka agụmakwụkwọ Eze.\nIhe a ị na-ekwu o si gị n’obi pụta? N’ezie o si n’obi m niile. Eze dị m mkpa hinne. Mana karịsịa, achọrọ m ka o jee akwụkwọ, n’ihi na nke a bụ ihe nna ya kwadooro ya.\nỌ dị mma, ị ga-ekwe ka mụ na Eze biri na be m? M ga-ahụ na Eze na-eje akwụkwọ. M ga-ahụ na ọ gurụ akwụkwọ rue ebe ike m ha.\nNne Eze bere akwa, anya mmiri ọṅụ na obi ụtọ si n’anya ya na-erudata na nti ya. Ọ maghị ihe ọ ga-ekwu. Mgbe Eze lọtara, nne ya gwara ya na ọ ga- aga ibiri na nke Maazị Ọkafọ bụ onye ga na-akwụrụ ya ụgwọ akwụkwọ. Gị nwa kwanụ, nne ebee ka ị ga-eje? Eze ji ezi mmetụta gwa nne ya nke a.\nEchela maka m, nwa m, aga m anọ ebe a m ga na-ahụ gị mgbe ọ bụla m bịara ahịa. Echegbula onwe gị maka m, aga m adị mma. Mgbe adịghị anya, Eze gara biri na nke Maazị Ọkafọ. Ndị be ya lara na be ha n’ihi na nwunye ya dị ime. Eze abụrụla odibo Maazị Ọkafọ. Ọ bụ ya na-esi nri, asụ akwa na-arụchasị ahịhịa. Nke a anaghị ewute ya n’ihi na ọ na-eri nri otu o siri chọọ ma na- enwekwa ohere agụ akwụkwọ ya ebe Maazị Ọkafọ nọkwa na-agbaziri ya. A na- ahapụkwa ya iwere akwụkwo Maazị Okafọ amụ akwụkwọ.\nNne Eze na-abịa ahụ ya ụbọchị ahịa ọ bụla. Ụbọchị ọ bụla ọ ga-abịa, ọ na-ewetara Eze na Maazị Ọkafọ ihe onyinye akwụkwọ nri, mmanụ na ihe ndị ọzọ na-atọ ụtọ a na-eri eri nke ọ na-eme n’onwe ya.\nObi na-atọ Maazị Ọkafọ ụtọ maka Eze. Ọ dị afọ iri na otu ugbua ma na- agbasi mbọ ike n’ọrụ na n’akwụkwọ ya. Maazị Okafọ ná-ahụ ya n’ọrụ ma ọ bu n’ebe ọ na-egwuri egwu, ọ na-adị ya ka ya bụrụ na Eze bụ nwa afọ ya. Ụbọchi ọ ga-abụ echi ya ka ụlọ akwụkwọ Sentral dị n’Obodo emepee, Maazị Ọkafọ zụtara Eze akwa akwụkwọ ọhụrụ, akwụkwọ na ọmarịcha akpa akwụkwọ. Eze kelere ya n’ihe ndị a ma kwe onwe ya nkwa na ya agaghị agharịpụ ndị niile na- enyere ya aka.\nNa mgbede ahụ, mmadụ ise ahụ, bụ ndị mere nke ọma n’ule bịara ịhụ Maazị Ọkafọ ka o wee nye ha ndụmọdụ ikpe azụ.\n“Ọ bụrụ na unu jerue n’ụlọ akwụkwọ ahụ, kwanyere onwe gị ụgwụ. Ọ bụrụ na unu mee nke ọma, ọtụtụ ụmụ akwukwọ si n’ụlọ akwụkwọ a ga-enwe ike nweta ohere n’Obodo. Ọ bụrụ na unu emeghị nke ọma, ị mara na unu na- emechiri ndị ọzọ ụzọ. Unu adịla eche maka naanị onwe unu, unu ga na-echekwa maka ndị ọzọ.\n“A lụkwala ọgụ, ka a ghara iji okwu ọjọọ mara unu. Na-asọpụrụnụ ndị nkuzi nọ n’ebe ahụ Dị ka unu sị asọpụụrụ m. Na-erubere iwu niile isi. Na- emesonu ndị nkuzi na ụmụ akwukwọ unu nke ọma. Achọrọ m ka unu na- egosipụta onwe unu ka ụmụ akwụkwọ a zụrụ nke ọma”.\nNwata nwaanyị ahụ bụ Chinwe jụrụ sị, “biko nna anyị ukwu, anyị ga-ebi n’ụlọ akwụkwọ ahụ ka anyị ga-esi ebe a eje akwụkwọ kwa ụbọchi?”\nUnu ga-esi ebe a na-eje akwụkwọ. E nweghị ọtụtụ ụlọ ebe obibi e wee dobere ya ndị be ha dị anya. ‘Mana nke anyị dị anya “n’eziokwu maịlụ ise, ka otu nwata nwoke a na-akpọ Azi kwukwara.\nAma ga-adị ka o tere aka n’ụlọ akwụkwọ Sentral dị n’Obodo mana o teghị aka ọ bụla maka na o nwere ụmụ akwụkwọ ndị be ha dị ihe ha ka maịlụ iri rue iri na ise. Ọ bụ maka ha ka e jiri rụọ ebe obibi.\nOtu n’ime ha a na-akpọ Belụ jụrụ ajụjụ sị, o nwere onye ga-abịa kọwara onye isi Sentral skulu ndị anyị bụ?\n‘Ee, m ga-eso unu jee? Nke a mere ka obi tọọ ụmụ aka a ụtọ n’ihi na ha na-eche otu ha ga-esi me n’ụbọchị mbụ ha n’ụlọ akwụkwọ ọhụrụ ha. Ọ ka nwere otu ihe fọdụrụ. Ọ bụrụ na unu jee n’Obodo, unu ga-ahụ ọmarịcha ụlọ dị iche iche, ụgbọala na ihe ndị ọzọ bụ ihe ọhụụ na ihe ndị ga-agba unu gharịi. A kwụrụkwala na-ele moo. Ọ bụrụ na i mee ya, ị ga-adaba n’ihe mberede dị iche iche. N’ezigbo ọnụ ụtụtụ echi, ha hapụrụ obodo Ama. Oyi na-atụ, ya mere ha gasibere ije ike ka ahụ wee kpoo ha ọkụ. Ụzọ ahụ sara mbara ma jupụta na etum n’ihi na e teghị ya korota. Onye ọ bụla n’ime ha yiiri akwa akwụkwọ ya ma nyara akpa akwụkwọ ya tufee n’azụ ya.\nHa ekwughị ọtụtụ okwu n’uzọ; ọ bụ ezie na Maazị Ọkafọ bụ enyi ha mana ha na-enye ya nsọpụrụ na-atụkwa ya egwu ka onye nkuzi ha. Ọ bụ naani mgbe ọ kpara ha ọchi,jụọ ajụjụ ma ọ bụ tụọ ihe aka ka ha na-ekwu okwu ma ọ bụ chịa ọchi. N’ikpe azụ, mgbe ha gachara ije ihe ha ka otu awa na ọkara, ha rutere Obodo nso. Ụlọ niile ha hụrụ dị ka ha na-aba n’ime Obodo ahụ enweghị nke tụrụ ha n’anya naanị ụlọ ole na ole, ha adịghị iche n’ihe ha na-ahụ n’Ama. E wepụ na ụfọdụ buru ibu. Ole na ole n’ime ha pụrụ iche gụnyere ụlọ ụka St. Barthlomew nke nwere tọwa abụo toro ogologo, ụlọ elu ukwu ole na ole na ọfiisi Distrikiti e jicha okwute siri ike rụ ha ma chọkwaa ahụ ha mma pụrụ iche. Ha gagidere tutu rue mgbe ha batara n’ụlọ akwukwọ ahụ. Ọ bụ nnukwu ụlọ e ji okwute were rụ nke nwere windo e hujiri ehuji ma o nweghị ihe e ji emechi ha, ọ bụ naanị ogidi nke e guzobere na mkputamkpu obo aja ndị ahụ pere mpe ka e ji kewasị ha. Maazị Ọkafọ tụụrụ ha aka n’ụlọ onyeisi ụlọ akwụkwọ, ụlọ ebe ndị nkuzi bi, ụlọ Onye nlekọta agụmakwụkwọ na ụlọ ndị ụkọchukwu. Ọ bu okwute ka e jiri rụ ha niile mana e tere ha niile nzu na-acha iche iche.", "N’ụlọ akwụkwọ ọhụụ a, ihe mbụ ha na-eme bu ikpe ekpere ma bụkwaa abu. Emesịa onyeisi ụlọ akwụkwọ, bụ obere nwoke nwere olu na-ada ka egbe eluigwe kwuru okwu sị ndị niile bịara ọhụrụ cherenụ n’ezi n’akụkụ ụzọ mbata. Ndị ochie niile jeenụ na klaasị unu nọdụ.\nMaazị Ọkafọ na ụmụ akwụkwọ ya tinyere ndị ọzọ bịara ọhụụ na ndị nkuzi ha chere ihe ha ka nkeji miniti iri atọ tupu Onyeisi ụlọ akwụkwọ abịa ịhụ ha.\nMgbe ọ bịara, o nwere ibe akwụkwọ o ji - ọ sị Dị ka ọ na-arụ aka. Ọ bụru na ị nụ aha gị, kwụrụ ebe a’ Emesịa, ọ kpọọ aha mmadụ iri atọ na ise Dị ka ha siri meta nke ọma n’ule ahụ, ‘Eze Adị, Chinwe Ndụ,… guzo n’azụ Eze… Azi Okoli guzo n’azụ ya. Dị ka unu na-apụta, na-akwụrụnụ n’azụ onye ahụ ị na- eso… Belụ Mba…” Ọ gara n’ihu rue mgbe ọ kpọrọ aha mmadụ iri atọ na ise.\nNdị nkuzi abụọ guzo n’azụ onyeisi ụlọ akwụkwọ ndị na-ahụ ka e siri kwụrụ n’ahịrị ma na-agụpụta mmadụ iri mbụ ‘Maazị Rapụ,” ka ọ kpọrọ, iji mee ka otu n’ime ndị nkuzi ahụ lee anya, ‘gị nwa kpọrọ mmadụ iri a jee na klaasị gi, ma gị Maazị Ogbonna kpọrọ ndị ọzọ fọdụrụ. Maazị Rapụ bụ nwoke toro ogologo, bụrụ nwa okorobịa mara mma nke ahụ siri ike. Ọ na-achịkarị ọchị. Ụmụ aka ọhụụ ndịa na-ekpe ekpere ka obi ya dị ka ihu ya dị. Maazị Rapụ gwara ụmụ aka ahụ sị “Sonu m”, ha wee soro ya gaa, baa na klaasị ebe ụmụ aka dị iri na ise nọdụgororịị ala. ‘Ndị enyi’, o kwuru na-agwa ndị bịara ọhụrụ, nnọnụ na Standadị IIIA.\nMaazị Rapụ kpanyeere nwata akwụkwọ ọ bụla ụka dị ka ọ na-achọ ka ọ mata ihe gbasara ha. Ọ bụ ihe tụrụ ya n’anya mgbe ọ chọpụtara na ụmụ aka atọ bu ụzọ si n’Ama, ma mgbe ọ ghọtara na ọ bụ Maazị Ọkafọ bụ onye nkuzi ha, ọ sị ka m sịkwa n’ihi na ọ maara Dị ka ndị nkuzi ndị ọzọ kwa ụdị ụdụ Maazị Ọkafọ nwere.\nIzu ụka nke mbụ enweghị ihe pụrụ iche mere na ya karịa na ụmụ aka ndị si n’ime obodo ka a na-ahụ ka ndị si n’ime ọhịa. N’ezie n’ ụbọchị mbụ, mgbe e dozichara otu a ga-esi nọ na klaasị, ụmụ aka ndị ahụ nọ n’obodo mepere emepe na-anọpụrụ onwe ha iche n’ebe ndị ọzọ nọ. Ha na-emechi imi ha mgbe ụfọdụ iji gosi na ụmụ aka ndị ahụ na-esi esi ma n’eziokwu, ọ bụ ụfọdụ n’ime ha na-esi isi n’ihi na ha anaghị asa ahụ mgbe ọ bụla maka na mmiri dị ụkọ n’Obodo. Nke a anaghị amasị Eze ma ọlị. Eze na ndị otu ya si Ama na-agbalisi ike ịkpa agwa ka ụmụ aka ndị ahụ nọ n’Ọbodo mepere emepe mana a na-akpọ ha aha ọjọọ ma na-achịkwa ha ọchị. Otu mgbe, Eze na Pita bụ nwata dị nwayọọ si n’Obodo mepere emepe na-agụkwa Standadị III ya na Eze bụrụgoro enyi nọ.\nIgwe na Nwafọ ndị ha na ha nọkwa n’otu klaasị mana ha maara ka e si akponye mmadụ n’imi bịakwutere Eze na Pita. Igwe wee jụọ Pita sị, ‘Gịnị ka gị na onye ahụ na-amaghị ebe a nọ na-ekwu? Pita zara ya sị, “Ana m achọ ka m nyere ya aka na nsogbu o nwere n’ịghọta ihe e mere na mgbakọ na mwepụ.” ‘Ọ bụ isi ọkpụkpụ n’ịghọta ihe’ ọ bụ naanị n’ọrụ ugbo ka ọ dị mma. Nke a bụ naanị ọrụ ndị be ha maara anya ya. Nwafọ, onye ndị mụrụ ya nwere ego ma were ya na-azụtọ ya n’ihi na ọ bụ otu nwa nwoke ha mụrụ, chịrị ọchị Pita zara ya sị, ikekwa mgbe ndị ọzọ na-achọ inyere ndị ọzọ aka, naanị ego nna gị ka ị na-eche na otu ị ga-esi mefu ha niile.\nMgbe ahụ Eze kwara ụkwara, ha leghaara ihe Pita kwuru anya ebe Igwe kwuru n’ụdị mkparị sị, ọ bụ ihe dị imere ebere na ụmụ nwoke ndịa sị n’ime obodo karịsịa ndị si n’Ama enweghị ezigbo omume. Anyị na-agbalisi ike ikuziri ha, mana ha anaghị ekwe amụta.\nKedụ ihe ọjọọ m mere? Eze jụrụ na mwute n’ihi mkparị a na-enye ụmụaka si n’ụlọ akwụkwọ Ama. Ọ bụ na etinyeghị m aka n’ọnụ m ka ọ bụ na ewepụghị ihu n’akụkụ mgbe m kwara ụkwara? Nke ahụ ezughị. I kwesịghị ịkwa ụkwara mgbe gị na ndị ọzọ nọ karịsịa ndị ka gị mma. M gwa ka anyị pụọ, Nwafọ ka ọ ghara ibunye anyị nje juru ya ọnụ.\nEze na-ele ha anya ka ha na-apụ. O jidere onwe ya na-agbalisi ike ịnọgide na ndụmọdụ Maazị Ọkafọ nyere ha, ka ha ghara ịlụ ọgụ n’ụlọ akwụkwọ. otu ihu ahụ, Belụ gbakwutere Eze ma gwa ya na Azi, otu n’ime ndị sị Ama na otu nwata nwoke si obodo mepere emepe na alụ ọgụ n’ihi na onye ahụ si n’ebe mepere emepe kpọrọ nna ya ezi. Eze na Pita gbara ọsọ gawa ebe ahụ, mana tupu ha erue ebe ahụ, otu nnukwu nwata nọ na Standadị VI egbosaala ha, wee na-ege ntị ihe butere ọgụ ha. Azi bụ onye nke pekarịsịrị na ndị si Ama dị nwayọọ dịkwa ọcha. Onye ya na ya na-akpọtụ bụ Nwafọ. O bukarịrị Azi mana akwa ya bụ sọ etum n’ihi ntụda a tụdara ya. ‘Ụmụ aka ụmụ nwoke a sitere Ama bụ anụ ọhịa, Igwe kwuru n’ịkwado enyi ya. Chinwe gwara Eze na nkwuwa okwu na oluike sị, I kwesịrị ịhụ otu Azi siri tụọ ya n’ala ugboro atọ. Aga m azụtara ya ahuekere ma a gbasaa akwụkwọ taa! Nwata nwoke ahụ nọ na Standadị VI na-agwa ha abụọ sị, unu alụkwala ọgụ ọzọ. Ọ bụrụ na a kpasuo gị iwe, jee kpesara onye nkuzi klaasị gị, e kpebila otu o si masị gị.\nA bịa na klaasị, ụmụ aka ndị si Ama na-aga ụmụ nwoke ndị ọzọ n’ihe niile a na-akụzi, ihe ha na-amasị Maazị Rapụ nke ukwu, ọ na-emekwa ihe o nwere ike ime iji nyere ha aka ịgan’ihu n’ihi na ndị ahụ si n’ebe mepere emepe bụ ndị na-akponye mmadụ n’imi bụrụkwa ndị na-aluta ọgụ.\nMgbe a na-eme ihe ọmụmụ mgbakọ na mwepụ n’otu ụtụtụ Mọnde, Maazị Rapụ jụrụ Ọnụ, nwata nwoke ahụ bukarịsịrị na klaasị ka ọ gụgharịa mmụbanye ọnụọgụgụ. Ma o nweghi ike. A gwara Eze ka ọ gụọ ya n’isi, mgbe ọ gụrụ ya nke ọma, a gwara ya ka ọ kụọ Ọnụ ezigbo ọkpọ n’isi. Mgbe a pụrụ igwuri egwu n’ụbọchị ahụ, Ọnụ sere ihe osise nwaanyị gba ọtọ wee dee na ọ bụ nne Eze, nwaanyị ime obodo. Ọ gara n’ihu na-egosi ya ndị ọzọ, ndị na-achị ihe ahụ ọchị.\nNke a bụụrụ Eze nnukwu mkparị, ọ na-edi mkparị niile n’onwe ya mana ọ gaghị anọ ndụ hụ mmadụ ka ọ na-akparị nne ya. Anya ya dị ọkụ n’ihi Iwe. Ọ mịchara akwụkwọ ahụ n’aka Ọnụ wee gbaba na klaasị zoo ya. Mgbe o chighatara, Ọnụ dọdoro ya n’akwa elu ahụ ya na-asị ya ka o nye ya akwụkwọ ahụ. Eze chetara na ụmụ nwoke niile si Ama enweela otu onye si n’obodo mepere emepe ya na ya lụrụ ọgụ ha meriri, na o nweela nsọpụrụ a na-enye ha. Ugbu a nleda anya niile ha, na mmegbu niile, na mmaja na nkwutọ ha bụ Eze ka ha na-edozi ihu. Ugbu a, ọ hụtara ya na ọ bụ oge iji weta mkparị niile ndị a n’isi njedebe.\nO chere n’obi ya ije buru ụzọ gwa onye nkuzi mana ndị nkuzi niile nọ na nzukọ. Aka Ọnụ ji ya n’uwe elu ya tadoro ya n’akpịrị, akwa elu ya na-achọ ịdọka. Eze gbalisiri ike ịtọhapụ aka Ọnụ mana Ọnụ kwedosiri akwa ya ike, o wee dọka hinne.\nN’ezie, ihe onye chọ ka ọ hụ’ Eze tiri mkpu ka o ji aka nri ya kụọ Ọnụ ọkpọ n’agba. Ọkpọ ahụ o ji ike ya niile kụọ mere ka ọ sọro ganagana daghachiwe azụ. Mgbe Ọnụ nwetara onwe ya, ọ wee kọba Eze ọnụ. ‘Onye nzuzu, enwe, i jirila aka ruru inyi Dị ka nke enwe suo m ọkpọ. M ga-akụziri gị ihe ị na-agaghị echefu echefu. Mgbe ọ na-agbapụ ka ọ makụọ Eze, Eze hulatara ala ma tupu ndị ọzọ amara ihe na-eme Onụ adaruela ala ka ogwe osisi. O ji nwayọọ bilie na-abịakute Eze. Ha abụọ makụọ onwe ha. Eze na-echekwa na ya enwetala Ọnụ n’ọnọdụ ọ ga-atụ ya n’ala ọzọ, ma ọ gbajọrọ ya. Dị ka ọ na-achọ ka o jide ya, o zohiere ụkwụ na-achọ ịda, Ọnụ hapụrụ ya aka, Eze wee daa.\nO biliri ngwa ngwa ebe ụmụ nwoke ndị ahụ si n’ebe mepere emepe na-achị ya ọchị. Nke a wutere Eze nke mere na ọ bagidere Ọnụ kpebie na ya ga-abọrọ mkparị ahụ. Ha bagidere onwe ha ọzọ jidesie onwe ha aka ike. Ha jigharịrị ma higharịa onwe ha, onye ọ bụla na-achọ ka o jidekarịsịa ibe ya ike. Ha na-eku ume n’ike n’ike, akwara na-apụta n’ihu ha. Ha na-enugharị onwe ha ma na- adọkpụgharịkwa onwe ha. Ha mere nkea ogologo oge mgbe Ọnụ zohiere ụkwụ. Eze onye ma anya mgba karịa Ọnụ weere ohere a wee jidesie ya ike. O were ụkwụ ya rụdosie ụkwụ akaekpe ya ike n’ala ebe Ọnụ onye gbalisiri ike iguzoro onwe ya dara kụọ ike akaekpe ya n’ala. Eze wee kwolie, Dị ka o mere nkea, o buliri Ọnụ site n’igbali ụkwụ akaekpe ya elu, tulie ya elu, ọ daa gwom n’ụkwụ Chinwe.\nMgbe Ọnụ dara n’ala, Eze magoro ya n’elu nọdụ ala n’obi ya were ikpere ya jisie aka ya abụọ ike n’akụkụ. Ọnụ enwekwaghị ike ọ bụla. Eze malitere na- ekpoju ya aja n’ọnụ sị m ga-akụziri gị ihe, ọ bụ ezie na m pere mpe mana akarịrị m gị. Ị ga-enyerịrị m nsọpụrụ kwesịrị m ma hapụ nne m na ndị niile metụtara m aka mgbe ọ bụla ị na-achọ ịkparị m.\nMgbe nke a na-eme ka onyeisi ụlọ akwụkwọ siri n’ọgbakọ ha ahụ pụta ma bịa ebe ahụ ndị mmadụ gbakọrọ. Ọ dọdoro Eze na ntị dọpụta ya, ma kpọrọ ya na Ọnụ banye n’ọfisi ya. Ụfọdụ ndị na-elele ha ka a kpọrọ ka ha kọwaa ihe na-esere ha. Na mbụ, o nweghi onye nwere ike ịkọwa ihe butere ọgụ ahụ; mana otu obere nwata nwaanyị si n’ebe mepere emepe kwuru na Ọnụ sere nne Eze n’akwụkwọ na Eze naara ya n’ike, wee zoo ya. Onyeisi Ụlọ akwụkwọ gwara Eze ka o weta ya, mgbe ọ hụrụ ihe ahụ o sere, ọ gwara ụmụ aka ndị ọzọ ka ha pụọ ma gwa Ọnụ n’olu ike na ihe onye chọ ka ọ hụ. ‘Mana, o kwuru n’iwe sị, ka m kuziere unu abụọ ihe maka ịlụ ọgụ n’ụlọ akwụkwọ m ka e wee site na nke a kuziere ndị ọzọ Dị ka unu ihe, aga m apịa unu abụọ ube ụtarị isii isii. Gaanụ n’akụkụ ka unu kpụtuo nịka unu.", "Na mbụ Eze na-eme nke ọma na klaasị ya na Chinwe bụ onye na- achụkarịcha ya. N’oge mbụ, o na-eleda ụmụ nwaanyị anya Dị ka ndị na-erughị ya ma Chinwe na-eme ka ọ ghọta na nke a bụ omume nzuzu. Ugbu a o bidola inye ya nsọpụrụ. Mgbe ụfọdụ ha na-enyerịtara onwe ha aka n’ọmụmụ akwụkwọ ha.\nIzu ụka abụọ tupu ule akwụkwọ erue, ahụ malitere ịrịa Eze. Na mbụ ọ na- ebu ya eje akwụkwọ. O mechaa, o nweghịkwa ike ịga ogologo ụzọ ahụ ọzọ. Ka otu izu ụka gachara, Ọnụ, Nwafọ na Igwe gara ñụrụ inyinyaigwe wee si Obodo jee Ama ịhụ ya. Ọ bụ ezie na Eze nwere ihe mgbu n’akụkụ ya na n’obi ya mana obi tọrọ ya ụtọ ịhụ ha, maka na o nyere ya oghere ya na Ọnụ iji wee mee udo.\nHa na ya nọrọ ogologo oge. Ka ha nọ, Azi, Chinwe, Belụ na Dede bịara ka ha mara otu Eze mere. Ha niile nọrọ na-akparị ọchị, ọ dị Eze ka ihe na-eme ya adịla mma. Nke a bụ mbụ ụmụ aka si n’Ama na ndị si n’ebe mepere emepe na-ekwukọrịta okwu nke ọma.\nN’echi ya, ọnọdụ Eze ka njọ, nke mere na a kpọọrọ ya jewe ebe a na-ahụ ndị ahụ adịghị dị n’Obodo. Dọkịta na-elekọta ebe ahu na-esi esi abịa sịrị na o bụ oyi bara ya ahụ n’ihi ya na ọ ga-anọ n’akwa dị ebe ahụ.\nNne ya siri Ọhịa bịa Obodo ka ọ na-esiri ya nri. Ndị enyi niile o nwere mgbe ya na di ya nọ n’ebe ahụ na-enyere ya aka. Ha na-enyere ya aka elekọta Eze mgbe niile ọ nọ n’ebe ahụ. Eze enweghi mgbe ọ hapụrụ ebe ahụ rue ọnwa abụọ mgbe ihe na-eme ya dịchara ya mma. Ọ fọdụrụ ọnwa abụọ ka elee ule nke ọkara afọ mgbe Eze malitere akwụkwọ ọzọ. Ndị ha na ya nọ na klaasị na ndị enyi ya nwere obi añụrị na Eze ebidokwala akwụkwọ. Eze gbalisiri ike ịmụta ihe ndị ahụ niile e mere n’azụ ya mana ọ bụ ihe siri nnukwu ike. Mgbe oge ruru, ọ bara ilele ule ahụ, ọ ma nke ọma na o nwere obere ohere ime ọfụma. Naanị ihe ọ chọrọ bụ ka a sị na ọ gafere. Mgbe a kpọro rịzọọltụt, Eze dara ada. Ọ bụ ezie na o nwere nkoropu obi, mana ndị klaasị ya, ndị enyị ya, Maazị Rapụ tinyekwara nne ya na Maazị Ọkafọ gwara ya ka obi ghara ịjụ ya oyi. Na ọ bụ ọrịa ya kpatara nke a. Ha gwara ya na ọ bụrụ na ọ gusie akwụkwọ ike ugbua ahụ dịrịla ya mma na ọ ga- ewerekwa ọnọdụ ya n’oge ule ikpeazụ nke Standadị III ga-abịa.\nMgbe a nọ n’ezumike nke Ọgọstụ, Maazị Ọkafọ kuziiri ya ihe nke mere na mgbe e bidoro taam ahụ, ọ hụrụ na ya enwetala onwe ya ma marakwa ihe ndị ahụ ọ maghị. Ya na ndị klaasị ya anọdụla otu ebe.\nOge a na-eme ihe egwuregwu ndị ọzọ agaala ma ugbụ a ọ bụ oge egwuregwu bọọlụ, ịsọmpi nke klaasị na klaasị na-abịa. Ọ bụ n’otu n’ime oge ndị a ka Maazị Rapụ onye na-ahụ maka egwuregwu chọpụtara ụmụ aka nwoke atọ si Ama ndị ga-abụ ndị ọkacha n’egwu bọọlụ n’ọdịnihu. Ha bụ Belu, Dede na Eze. N’inye ‘ha obere nkuzi, Belụ na Dede weghaara ọnọdụ ụmụ aka nwoke abụọ ndị nọ n’òtù ndị obere (junịọ tim) Belụ na-agba akụkụ akanri n’ime, ebe Dede na-agba akụkụ akaekpe n’ime. Ahụ adịghị onye na-agba ọnọdụ nke etiti, Eze wee weghara ọnọdụ ya. Ụmụ nwoke atọ a si Ama dị egwu ọ teghi aka ha mere ka ụlọ akwụkwọ ha dị n’Ama nwee ezi aha nakwa Maazị Ọkafọ onye na- ekwu na ha bụ mkpụrụ mbụ ahụhụ ọ tara makarịchara mma. O ji ha eme ọnụ, mana ọ dịghị eme nke a n’ihu ha.\nNwayọọ nwayọọ ka Eze jiri wee rụgolitekwa onwe ya Dị ka onye nke mbụ na klaasị, ọ bụ ezie na o siiri ya ike ịgafe Chinwe. O juru Eze anya na n’ime mmadụ niile na ọ bụ ndị ikwu ya bụ ndị na-enweghị mmetụta n’ihe gbasara akwụkwọ ya. O nwere otu nwata nwoke ọzọ si Ọhịa eje n’ụlọ akwụkwọ dị n’Ama mana ọ bụ naanị ka o jee kụpụ Eze. N’ebe Iwe nna nwata nwoke ahụ nọ, o nwere olileanya na Eze ga-akwụsị akwụkwọ n’ihi ụgwọ akwụkwọ ka nwa nke ya wee bụrụ nwata nwoke mbụ gụchara Standadị VI n’Ọhịa, o chefuru okwu a na-ekwu Chineke na-achụrụ ehi enweghị ọdụ ijiji.\nEze na-eche mgbe niile ihe kpatara na ndị ikwu ya enweghị mmasị n’ebe ọ nọ nke a mere ka o jiri nwayọọ malite inwe obi ilu n’ebe ha nọ. Na mbụ, ọ na- abụ ọ bịa na be ha n’oge ezumike ma ọ bụ jee ileta nne ya, ọ na-eje ekele ha Dị ka ọ dị n’omenala. N’oge a, mgbe o jere ụlọ n’oge ezumike, o leghara ndị ikwu ya anya maka na ọ n-echeta otu ha siri mefusịa akụ na ụba nna ya. O jeghị ka ọ hụ ha ma mgbe ha kpọrọ ya, ọ na-enwe otu ụsa ma ọbụ ọzọ ọ na-enye ha. Ọ na- achọ ka ha ghara ịdị na-ahụ ya n’obodo na n’ama, na mmiri na n’ụzọ ahịa Ama. Ọ jụrụ na ya agaghị edezịrị ha leta ma ọ bụrụ na ha akwụghị ya ụgwọ tupu ya odee ya. N’obere ihe ọ bụla ụmụ ha mere ya na-amaghị ama, ọ naghị eleghara ha anya. Ọ na-eti ha ihe. Mana ọ bụ maka ihe ọjọo dị iche iche ndị nna ha na- eme ya.\nNne ya achọpụtala na ọ gbanweela n’ịbụ nwatakịrị dị nwayọọ baa n’onye na-anaghị ekwe ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.\nNne ya kpọrọ ihe a asị nke na mgbe ọ bụla ọ kụrụ nwa ọ bụla ihe, ndị mụrụ nwa ahụ na-abịa amaja Eze na nne ya, mana nke a enweghị ihe o mere n’ebe Eze nọ.\nỌnọdụ a na-ewute nne ya ma na-akawanye njọ kwa ụbọchị. Ya mere, otu ụtụtụ, ọ gwara Eze ka o bukọrọ ihe ya laghachi na nke Maazị Ọkafọ n’Ama ebe o gaghi enwe ohere ịdị na-eme ihe sọrọ ya. O zigaara Maazị Ọkafọ ozi pụrụ iche. Maazị Ọkafọ ataghị okwu eze wee gwa Eze okwu. O mere ya ka o kwe nkwa na ọ ga-agbanwe ma mewezie ezi ihe. N’ezie obi na-atọ Eze ụto. Ndị bụ ndị ezigbo enyi bụ Maazị Ọkafọ na ndị klaasị ya si Ama.\nO bụ n’oge ezumike ka ndị soja si Ama na obodo ndị gbara ya gburugburu malitere ịlata ụlọ. Ahụ mara ọtụtụ n’ime ha mma ma sikwa ha ike. Ha agaala Oru na Igbo, ha ejeela Gold Koost, Sierra Loonu, Ijipt, Palestin, Saudi Arabịa, Indịa na Boma. Ha ahụla ndị okaịkpe, ndị nginịa, ndị dọkịnta, ndị nkuzi, ndị na-arụ ọrụ oyibo na ndị ọzọ a zụrụ azụ nke ọma. Ha ahụla ihe ndị dị otu a merela ndị be ha. Ha na-atụle obodo ndị ahụ ha jere na obodo nke aka ha wee kpebie na ha onwe ha gaara aga n’ihu Dị ka obodo ndị ahụ ma a sị na ha gụrụ akwụkwọ. Ha enweela mkpebi na ha ga-eme ihe ha nwere ike ime ịhụ na ha zụrụ ndị be ha mgbe ha lọtara. Mgbe ha nọ n’amị, ọtụtụ n’ime ha amụtala otu e si agụ na otu e si ede n’ụlọ akwụkwọ ndị okenye e nwere maka ndị amị. Onye ọ bụla n’ime ha na-eji aka ya edegara ndị be ha leta ma na-agụkwa nke ndị be ha detaara ha. Mgbe ha lọtara, ha nụrụ na ọ bụ Eze dere ụfọdụ n’ime leta ndị ahụ ha nwetara, nke a tụrụ ha n’anya nke ukwuu.", "Ndị soja, ndị dike n’agha si Ama, na-alata ụlọ n’otu n’otu. N’òtù ndị ikpeazụ ka e nwere otu nwoke si n’Ọhịa aha ya bụ Wilbafọọs Ezeilo. Ọ bụ obere nwoke, onye na-egbu opi agha, onye sajim. Ọ bụ n’amị ka e nyere ya aha a bụ Wilbafọọs. Ọ tụrụ ya n’anya nke ukwuu mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Eze dere leta ndị ahụ e ziteere ya. O wetaara ya onyinye akwa na ego.\nWilbafọọs bụ nwoke kwenyere n’omume karịa n’okwukwu. O kwenyere n’inye onye ọ bụla na-etolite etolite ohere maka ịga n’ihu. Kemgbe ọ banyere n’amị, ọ tụkwasịla na nkwenye o nweburu na agụmaakwụkwọ dị mkpa maka ịga n’ihu, na ụmụ Ọhịa niile ga-abụ ndị gụrụ akwụkwọ. Tinyekwara nke a na nwa ọ bụla na-eme nke ọma kwesịrị ka e nyere ya aka otu ọ bụla ike ya ha. Ọ bụ Wilbafọọs bụ onye ọzọ kwulitere mkpa ọ dị na a kwụụrụ Eze ụgwọ akwụkwọ ka e wee napụ Maazị Ọkafọ ibụ o bu, ebe nwunye ya mụrụ ejima.\nMgbe Wilbafọọs lọtara, o yi uwe amị ya gaa leta ụlọ akwụkwọ dị n’Ama. Maazị Ọkafọ na-asọpụrụ ndị amị ndị na-alụ ọgụ maka nchekwa obodo ha, mana nke a abụghị naanị ihe kpatara o jiri nabata ha nke oma mgbe ha bịara ileta ụlọ akwụkwọ ha. Ọ hụla mmasị ha nwere n’ebe agụmaakwụkwọ dị karịsịa n’ụlọ akwụkwọ ya. Ọ na-eche mgbe ụmụ akwụkwọ nọ n’ụlọ akwụkwọ ya ga-eru otu narị, e wee ziga ya n’ụlọ akwụkwọ ebe a na-azụ ndị nkuzi Dị ka ụgwọ a ga- akwụ ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ga-abụ onyeisi ụlọ akwụkwọ, nke pụtara inwetakwu ego, inwe ezigbo ebe obibi na ihe ịdịrị ya mfe.\nWilbafọọs Ezeilo jụrụ Maazị Ọkafọ ụmụ nwoke ole si n’obodo ọ bụla abịa akwụkwọ. Ọ chọpụtara na ndị si be ha pekarịsịrị mpe. Nke a tụrụ ya n’anya n’ihi na n’oge mbụ, Ọhịa na-abụ obodo na-egosi ndị ọzọ ụzọ. Mgbe ọ lọghachiri, ọ gara leta nne Eze. Ọ nụrụ otu di ya bụ Okonkwọ Adị siri nwụọ, na arịrịo ọ rịọrọ n’ọnụ ọnwụ ya, otu e siri kwa ya na ego di nwa ya Ụlụ nyere ha. Nne Eze gwara ya ọnọdụ ihe isiike ha na-agabiga na otu ụmụ nne di ya siri jụ ịkwụrụ Eze ụgwọ akwụkwọ na-agbanyeghị arịriọ niile Maazị Ọkafọ na Maazị Thomson rịọrọ ha. Ọ gwara ya otu Maazị Ọkafọ si were ebere gbatara ha ọsọ enyemaaka kama Eze ga-akwụsị akwụkwọ.\nỌ na-ebe akwa mgbe ọ na-akọrọ ya ihe ndị a. ‘Ugbu a’ Wilbafọọs kwuru, mgbe ọ nụchara akụkọ ya, hichaa anya gị, ebezịla ọzọ. Anọ m n’ụlọ ugbua, m ga-ahụ na m lekọtara unu anya nke ọma. Nke ọzọ agụmakwụkwọ nwa gị enweghị ihe ga-egbochi ya. Nne Eze lere ya anya na mgbagwojuanya. Mgbe o si ebe ahụ pụọ, ọ gara ịleta Chike nwoke afụọnụ ọcha ahụ. N’abalị ahụ, onye ọkụ ogene gagharịrị obodo niile kụọ ogene na e nwere nzukọ ndị Ọhịa niile n’ụtụtụ echi. N’ụtutụ, ndị Ọhịa, nwoke, nwaanyị, okorobịa, agbọghọbịa na ụmụ aka zukọrọ n’ama Ọhịa. Wilbafọọs, onye yi akwa ndị amị na-eyi n’ime ọhịa Boma, bịara tupu Chike bụ onye e bubatara n’ama ahụ n’ihi na o meela okenye. Mgbe mmadụ niile nọdụrụ ala, Wilbafọọs guzoro ọtọ kwuo okwu sị, Ndị m, ana m ekele unu niile. Obi na-atọkwa m ụtọ na m latara zute unu niile mgbe m nọchara ọtụtụ afọ n’ije m mana enwere m mwute n’obi. M gaghị agba okwu okirikiri. M ga-ekwu kpọmkwem ihe bụ isiokwu. O jughị m afọ ka ihe sị aga n’Ọhịa. Ọ bụ ikike nke chiifu anyị bụ Chike ka m jiri kpọọ oku a, ka anyị wee mezie ihe adịghị aga nke ọma.\nEbe niile dara jii mgbe o kwuchara okwu. Agụ kwuru okwu site n’ebe ọ no n’ihi na o buela nnukwu ibu nke na ịga ije na-ahịa ya ahụ. Kedụ ka ị ga-esi si n’ọrụ oyibo i jere lọta chọọ ka ị gbanwee ihe niile a na-eme na-erughị mkpụrụ ụbọchi abụọ i jiri lọta. Agadi Chike sịrị ya kpuchie ọnụ ya. Ọ sị Wilbafọọs gwa anyị ihe gị bụ onye, onye jerela Oru na Igbo huru ị na-eche anyị ga-eme ka Ọhịa wee dị mma gaa n’ihu. Wilbafọọs kelere ya Dị ka o guzoro ọtọ ịza aziza. Ị maara na oge gara aga na Ọhịa na-abụ ndị mbụ n’obodo niile gbara ya gburugburu. Unu ma na anyị na-edebere ndị ọzọ ihe atụ ha ga na-esonye. Unu maara na anyị bụ ndị jikọkarịrị onwe anyị ọnụ. Obodo ndị ọzọ na-asọpụrụ anyị ma na-atajiri anyị anya. Ọ kwụsịtụrụ ma jụọ ajụjụ ‘ọ bụ na ekwughị m eziokwu?\n‘N’ezie I kwuru, ụfọdụ n’ime ha tiri mkpu na-enweghị mmasị.\nUgbu a gịnị ka unu chọpụtara? Anyị echighaala were ọnọdụ nke abụọ ma ọ bụ atọ. Ndị ọzọ bụzị ndị na-atụpụrụ anyị ụkwụ egwu. Anyị ekerisiala n’etiti onwe anyị. Anyi ndị ọ na-adịbu ndi mmadụ ka ha ghọrọ anyị, ka ọ na-adịzị ugbu a ka anyị ghọrọ ha. Ihe ndịa ọ bụ asị? ‘mba’, otu onye n’ime ha tiri mkpu.\nIhe ndịa ha na-egosi agamnihu? ‘mba’, Mmadụ niile kwuru e wezuga Agụ nwere afọ ukwu na Iwe ajọ mmadụ.\nNsogbu niile bụ na ọtụtụ n’ime anyị esibeghị n’ime obodo a pụọ. Oge a bụ oge ga-eme ka ịdịnootu bụ nke e ji mara anyị siwanye ike, ọ bụrụ na i jee n’obodo mepere emepe ị ga-ahụ na ndị mmadụ na-ejikọ aka enyere onwe ha aka. Ha na-akwụrụ ụmụ aka ndị enweghị ka ọ ha ha ụgwọ akwukwọ; na-arụ okporo ụzọ na akwa mmiri, na-arụ ụlọ akwụkwọ, ụlọ uka, ụlọ ogbakọ, ebe a na- enye ndị ọrịa ọgwụ (Dispensa), ụlọ ọgwụ na ihe ọzọkwa dị iche iche. ‘Kedụ maka ụtụ isi anyị na-akwụ? Otu onye napụrụ ya okwu n’ọnụ, ‘ọ na- amụbawanye afọ ọ bụla. Gịnị ka nke a pụtara, ọ bụ na ọ bụghị ndị gọvmentị ga- alụrụ anyị ihe ndịa?\nEgo ụtụ isi a na-anakọ n’obodo a agaghị ezu ịrụ ihe ndị a ọ bụladị n’obodo mepere emepe Dị ka Obodo. Unu nwere ike sị na Ọhịa kara bara unụ ụrụ n’ihi ya na e kwesịrị ka a rụara unu ihe ndịa, mana nke ahụ abụghị eziokwu. Dị ka ndị be anyị na-ekwu sị, anya bewe, imi ebewekwa. Ebe a na-alụ ogụ a tere aka mana anyị si ebe a gaa lụọ ya n’ihi na ọ bụrụ na anyị emerighi, anyị niile nọ n’Ọhịa ga-ata ahụhụ maka ya. O nwere ebe na ihe ndị ọzọ ka mkpa a na-etinye ego ụtụ isi, ọ bụrụ na ego ndị ahụ ejeghị na ha, anyị ga-abụ ndị ga-ata ahụhụ ya.\nUgbu a, onye ọ bụla na-ajụ ajụjụ, Wilbafọọs zaa ha niile site n’ihe ndị ọ mụtara n’ọru amị ya. N’ikpeazụ, agadi Chike kwuru si, mana anyị agaghị anakọtazu ego iji me ihe niile ndị ọzọ na-eme. Anyị dị ole na ole. Gịnị ka anyi ga-eme?\nUnu anụtula maka ego ụtụ agụmakwụkwọ n’efu?” ‘Gịnị ka ọ bụ? Iwe jụrụ na mgbagwoju anya. Unu ahụla na ndị niile mụ na ha siri n’amị lọta na- arịọ ndị be ha ka ha ziga ụmụ ha akwụkwọ. Ha maara na ndị Ọhịa atufuola ọnọdụ mbụ ha, ha wee na-achị anyị ọchị. Anyị ka nwekwara ike iweghachi ugwu anyị ma ọ bụrụ na unu ga-anara ndụmọdụ m’.\nIhe ka njọ ga-eme ndị Ọhịa bụ mweda na ikpu ugwu ha n’ala. O mere ka onye ọ bụla n’ime ha wee iwe, ugbu a Wilbafọọs mere ka ihe niile ghere ha oghe n’anya. Ha dị njikere ime ihe ọ bụla, ịta ihe ọ bụla ga-abụ ihe mgbochi ahụhụ ka ha wee weghachị ugwu ha, mmara ama ha Dị ka ndị nke mbụ na gburugburu ha. ‘Anyị ga-eme ihe ọ bụla, ị ga-atụpụtara anyi, e wepụkwa igbu mmadụ bụ ihe ha gwarịtara onwe ha. ‘Ọ dị mma, anyị ga-arụ okporo uzọ ụgbọ ala ga-ejikọ anyị na Ama. ‘Nke ahụ bụ ihe dị mfe, ọtụtụ n’ime ha kwuru ‘mana ọ bụghị naanị nke a,’ Dị ka o kwuuru na-aga. Anyị ga-amalite inwe akpa ego agụmaakwụkwọ n’efu’.\nIwe jụrụ n’oke olu sị, gịnị bụ akpa ego a? kọwaa ya.\nEbe obodo ndị ọzọ na-agbalisi ike iziga ụmụ ha niile akwụkwọ, anyị ga- abụ ndị mbụ tụkọrọ ego n’otu akpa bụ nke a ga-edebe iche maka ịkwụ ụgwọ akwụkwọ ụmụ anyị na ịzụtara ha akwụkwọ.\nAgụ kwuru sị, ’ibu ahụ ga-akarị anyị ma ọ bụrụ na anyị ezigaa ụmụ anyị niile n’ụlọ akwụkwọ? ‘Mba. Sọ naanị anyị agaghị enwe ike iziga ụmụ anyị niile akwụkwọ ihe dị mkpa bụ na ihe ọ bụla anyị ga na-akwụ ga-abụ nwoke ọ bụla bụ onye Ọhịa ma ọ nọ n’ụlọ ma ọ bụ na ọ nọ n’Obodo ma ọ bụ na ọ nọ n’obodo ukwu Dị ka Ọnịcha ma ọ bụ Legọs.\nNke a dị ezi mma bụ ihe Chike kwuru. ‘Mana ahụghị m ka ị ga-esi kwụsị nwata nna ya so atụ ego irite uru so ya. ‘Ọ dị mfe, Wilbafọọs zara; Ndị niile chọrọ ka ụmụ ha jee akwụkwọ ga-ahụ ihe niile gbasara ha n’afọ nke mbụ mgbe e lelechara ule nke e ji efe klaasị ọzọ, ndị niile gafere bụ ndị a ga-akwụrụ ụgwọ akwụkwọ na akwụkwọ ha site n’akpa ego agụmaakwụkwọ n’efu ahụ rue mgbe onye ahụ gụchara standadị vi.\nHa enweghị ike inye mkpebi ha na nke a ozigbo, ya mere Wilbafọọs jiri gwa ha ka ha chee nke a nke ọma rue echi. Mana ihe pụtakarịchara ihe bụ akparamagwa ndị okenye. Mmadụ ole na ole e wezuga Iwe na Agụ ka a hụtara na ha ekwenyeghị site n’ihu ha, ma n’echi ya, ọha obodo kwekọtara iguzobe akpa ego agụmaakwụkwọ n’efu ahụ ebe Wilbafọọs nọ ka onyeisi ya. Ha dị mmadụ iri isii ndị nwere ike ịdị na-atụ ego n’ọnwa n’ọnwa. E kwekọtara na ụgwọ akwụkwọ Eze, akwụkwọ na akwa akwụkwọ ya bụzị n’akpa ego a ka a ga- esi akwụ ya.\nA gwara Eze na Wilbafọọs ka ha degara ndị Ọhịa niile anọghị n’ụlọ leta gwa ha maka akpa ego a.\nMgbe izuụka abụọ gasịrị, mgbe ndị Ọhịa abụọ ọzọ bụ ndị amị lọtara, ha sonyeere Wilbafọọs n’ịkpọ ndị be ha oku ka ha zukọọ. Nzukọ a kpebiri iguzobe òtù na-ahụ maka mmepe obodo. Ha họpụtara òtù kọmitii anọ: Ego, agumaakwụkwọ n’efu, mmepe na ala, Ndị amị a nwere olileanya na ọ gaghị ete aka, Ọhịa ga-abụ obodo ga-agakarị n’ihu na gburugburu ha niile.", "Eze dị afọ iri na abụọ mgbe ndị obodo ya nyere ya nkwado agụmaakwụkwọ n’efu. Nke a enweghị ihe mgbanwe ọ bụla o nwere n’ebe Eze nọ, karịa na ndị be ha n’ikpeazu bidoro inwe mmasị n’ebe agụmaakwụkwọ dị. N’ezie oge ụfọdụ, ọ bụụrụ ya oke ihe mwute, maka na mgbe ọ bụla o zutere onye ọ bụla so atụkọ egọ a, ọ ga-ajụ ya ma ọ na-agụsikwa akwụkwọ ya ike, ya marakwa na ọ ga-ahụ na ọ na-abụ onye nke mbụ na klaasị na taam ọ bụla. N’agbanyeghị nkea, agụmaakwụkwọ n’efụ ahụ wetara oke ọṅụ n’ebe nne Eze nọ, n’ihi na ihe di ya rịọrọ ka ọ na-achọ ịnwu abịala na mmezu. Onye nwekarịsịrị ọṅụ n’ime ha bụ Maazị Ọkafọ, onye na-ebu ya bụ ibu ụgwọ akwụkwọ Eze site n’oge dị anya. Ugbu a, ọ ga-amalite idebe ego nke ya onwe ya ga-eji je ụlọ akwụkwọ ebe a na-azụ ndị nkuzi karịchasịa idebe ego maka iji zụ ụmụ ndị nke ya mgbe ha ga-eje ụlọ akwụkwọ Sentral dị n’Obodo.\nNgwa ngwa ndị Ọhịa kpebichara iguzobe akpa ego agụmakwụkwo n’efu, ụlọ akwụkwọ dị n’Ama jupụtara n’ụmụ aka nwoke na nwaanyị ndị Ọhịa. O nweghị nne na nna ọ bụla chọrọ ka ego ọ na-atụnye n’akpa ego agụmaakwụkwọ n’efu bụrụ maka ụmụ aka ndị ọzọ. Ya mere ha kpọkọọrọ ụmụ ha niile tinye n’Ama na-ele anya na ha ga-adị nkọ irite uru sitere n’akpa ahụ. Nke a bụnọọ ihe Wilbafọọs chọrọ.\nỌ tụrụ obodo ndị ọzọ dị ha gburugburu n’anya otu ụmụ aka si Ọhịa siri nujuo n’ụlọ akwụkwọ dị n’Ama, ha mesịa chọpụta atụmatụ ndị Ọhịa jiri mee ka ndị nne na nna zigawa ụmụ ha akwụkwọ. Oge adịghị anya, ha tụpụtara atụmatụ ụzọ agụmaakwụkwọ n’efu nke ha. Atụmatụ ndị Ọhịa a gara nke ọma. Mgbe adịghị anya, a natara leta sitere n’aka ndị be ha na-arụ ọrụ na Legọs na Patakọọtụ tinyere ego nkwado akpa ahụ. Ha dum dere akwụkwọ iji gosi afọ ojuju ha nwere na n’ikpeazụ na o nweela onye kpaliri ndị bi n’obodo ha ime ihe gbasara ịzụ ụmụ ha n’akwụkwọ.\nN’ụlọ akwukwọ Sentral dị n’Obodo, nwatakịrị a bụ Eze gosiri n’eziokwu na nkwado ahụ e nyere ya ịgụ akwụkwọ n’efu abụghị ihe furu Ọhịa. Ọ na-agba onye nke mbụ na klaasị ya n’ihe niile ha na-eme n’ụlọ akwụkwọ ma ewezuga n’ihe gbasara mgbakọ na mwepụ. Onye ya na ya na-adụrịta ubu bụ Chinwe. N’ebe egwuregwu dị, Eze na-eme nke ọma ọ bụ ezie na o nweghị mgbe ọ laara ya na Dede na Belu ndị ha na ya nọ na klaasị site n’Ama. Belụ n’onwe ya na- eme nke ọma nke mere na ọ bụ onyeisi ndị otu bọọlụ nke obere n’ụlọ akwụkwọ.\nỌ bụ naanị otu ihe dị njọ n’ebe Eze nọ. Ọ bụ inwe mmụọ mpako. Nne ya achọpụtala nke a site n’otu o si etigbusi ụmụ aka si n’obodo Ọhịa. Maazị Ọkafọ agbalisiela ike ịgwọ ya ọrịa ahụ n’oge ahụ; mana ugbua ọ na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, ọ malitere na-eleda ọtụtụ n’ime ndị ya na ha nọ na klaasị anya karịchaa ndị nwoke ahụ sị n’ebe mepere emepe Dị ka Ọnụ na Nwafọ ndị na-ebu klassị n’isi mgbe ọ bụla. Ike anaghị agwụ Eze igosi na ya ma ihe na ha onwe ha adịghị nke ha ma. Ọtụtụ oge ọ na-agwa ha n’ihu na ha bụ ụbụrụ eke.\nNke a mere na ndị klaasị ha ahụghịkwa ya n’anya ọzọ. Belụ na Dede enweghị ike ịnagide oke amamihe ya. Mana ọ bụrụ na ọ bụghị maka ule Standadị VI na-abịa abịa, ndi klaasị ya akpaala nkata ụzọ ha ga-esi belata mpako ya, mana ule bịagidere ha ekweghị ha mee ihe ọ bụla maka ya.\nOkwu a na-ekwu na mpako buru ụzọ, ọdịda eso ya bụ nnọọ eziokwu n’ebe Eze nọ. Ọ banyere ule n’ezi ntụkwasịobi na ọ ga-abụ onye nke mbụ, ọ bụghị naanị n’ime mmadụ niile nọ na klaasị kama n’ebe ụmụ nwoke niile na-ele ule ahụ nọ na Distirikt Obodo nke nwere ụlọ akwụkwọ anọ. N’ezie ọ gbalisighi ike ịgụsi akwụkwọ ya ike tupu ule ahụ.\nN’ọnwa ahụ e lere ule ahụ ka rịzọlt ya pụtara. Onye mbu n’ime ụlọ akwụkwọ anọ ahụ bụ CHINWE. Eze lere rịzọlt ahụ na mgbagwoju anya, wee ledagide anya ruo, n’ebe onye nke ise bụ ebe ọ hụrụ aha ya. O chetara ịdọ aka na ntị nna ya: ‘nwa m nwoke, anwala anwa kwe ka Chinwe gafere gị n’ụlọ akwụkwọ.’ Mgbe o rutere Ọhịa nne ya makụrụ ya na-ekele ya na o mere nke ọma; ma Dị ka ihe si eme n’Afrika, akụkọ na-efe efe, obodo niile anụla na Eze bụ onye nke ise n’ebe ụmụ nwoke niile nọ n’Obodo dị. Onye ọ bụla bịara ka o kelee ya Dị ka onye mbụ ritere uru n’agụmaakwụkwọ n’efu ha. Anụ ọkụkọ na ofe pụru iche ka e ji kwado nri anyasị ụbọchi ahụ mana Eze erighị ya hinne. Nne ya enweghị ike ịchọpụta ihe kpatara ya, n’ime na o mere nke ọma, obi adịghị ya mma, mana o chọpụtara na o wedatatụrụ onwe ya ala, nwetụkwa obere nsọpụrụ karia ka o nwere ike icheta mgbe ọ hụtara ya n’ụdị dị otua.\nN’izu ụka na-eso, ndị niile ahụ gbara site n’onye mbụ rue nke iri n’ule standadi vi n’ime Distirikti ahụ ka e nyere ohere ile ule e ji aba koleji nke dị n’Ọnịcha. Eze mụgidere anya abalị atọ ruo ime ndeeli, na-amụ akwụkwọ nke ọ bukwanụ ọkụ si n’obere ite ọkụ mmanụ kọrọzịm ka ọ ji amụ ya. Nke a na- ewetatụrụ ya anya nsogbu. N’oge ehihie, Maazị Ọkafọ na-akụziri ya mgbakọ na mwepụ bụ ebe ọ naghị eme nke ọma. Ya mere, na-enwechaghị obi ike dị ka o nwere mgbe ha lelere Standadị VI, ọ banyere n’ime ụlọ ogbakọ ahụ dị n’Obodo ile ule. Ule ahụ tara akpụ nke na mgbe o lelechara ha, o doro ya anya na ya agaghị agakwa koleji kama na ya ga-achọrọ ọrụ Dị ka ode akwụkwọ n’Obodo ma ọ bụ bụrụ otu onye nkuzi Dị ka Maazị Ọkafọ.", "Ka ọtụtu ụbọchị gachara e lelechara ule ahụ e ji aba koleji, Eze na- agagharị na mwute n’Ọhịa, n’ihi na o doro ya anya na ya adaala. N’ezie ọ chọghị ije n’ụlọ akwụkwọ Sentral dị n’Obodo hụ rịzọọltụ pụtara. N’ụtụtụ, ka e zipụchara rịzọọltụ ahụ, Maazị Ọkafọ were nwayọọ na-anya ịnyinya igwe ya na- abata n’Ọhịa, were mpempe akwụkwọ na-efegharị n’aka ya na-asị, “Obere Eze apasịala ịga na nnukwu ụlọ akwụkwọ,” ọ na-eti mkpu ka onye ọ bụla na-agafe nụ ya, ma Chinwe nwata nwaanyị ahụ si n’Ama pasịkwara nke ya. Ọ bụ na unu amaghị na mmadụ abụọ ndị a bụ ụmụ aka mbụ siri n’ụlọ akwụkwọ m eje koleji?\nNa mbụ ọ gbara ndị mmadu gharịị ịhụ Maazị Ọkafọ, onye na-agbazi agba kwa afọ, ka ọ na-anyagharị obodo niile n’ụzọ ha enweghị ike ighọta karịa ihe ọ na-agwa ha. O were ha oge ịghọta na ịchọpụta na n’ọbodo ha na ọ bụ ha bụ ndi mbụ nwere nwoke a nabatara na nnukwu ụlọ akwụkwọ ahụ dị n’Ọnịcha nke ha na-anụ maka ya mgbe na mgbe.\nMgbe ahụ, Maazị Ọkafọ eruola be Eze ha. O tiri mkpu sị “pụta ebe a ọsịịsọ Eze, ihe ebube emeela.”\nEze nọ n’ime ngwuru be ha na mwute na-atuli okwute n’elu ma na- aghọrọkwa ha. O teela o jiri nọdụ n’ọnọdụ ahụ ihe ruru awa abụọ. N’obi ịjụ oyi, ọ jụrụ inyere nne ya aka ịza ezi. Maazị Ọkafọ tiri mkpu nke ugbo abụọ Eze, bịa. “Eze jiri nwayọọ bilie, wee gaa ka ọ hụ onye na-akpọ ya. ‘Ị pasịala ule ịba koleji site n’ịgba onye nke atọ’ Maazị Ọkafọ tiri mkpu ọṅụ. Eji m gị eme ọnụ ka a ga-asị na ịbụ nwa afọ m, ọ makudo Eze n’afọ ukwu ya.\nNgwa ngwa, Eze bụrụ onye a gbanwere. Mwute ya niile gbafuru, o were osọ gbaba n’ime ụlọ n’ọṅụ ịkọrọ nne ya akụkọ ọma a. Nne ya gbara ọmarịcha egwu n’ihu ha abụọ iji gosipụta ọbiụtọ ya ma ọ jụrụ ajụjụ sị ‘kedụ otu anyị ga- esi kwụ ụgwọ? Ego ole ka nke a ga-ewe?\nMaazị Ọkafọ gwara ya sị, nke a bụ nsogbu. Eze enwetachaghị ihe dị elu n’ule ahụ iji nweta agụmaakwụkwọ n’efu site n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ya mere ọ ga-akwụ pound iri abụọ n’afọ. ‘Anyị ga-agwa ndị kọmiti na-ahụ maka akpa ego agụmaakwụkwọ n’efu maka nkea.\nMgbe a gwara Wilbafọọs otu Eze siri me nke ọma, o juru ya afọ, ọ sị, m ga-eme ihe niile m nwere ike ime ịhụ na o nwetara agụmakwụkwọ n’efu. ‘Mana ọ dịghịkwa mfe. N’ihi na ọtụtụ ndị nọ na kọmiti ahụ na-eche na nwata nwoke Dị ka Eze ekwesịghị ile ule ịba koleji. ‘Standadị VI ezuolara ya; bụ ihe ụfọdụ n’ime ha gwara Wilbafọọs. Obere Eze ga-aka bara anyị uru ebea karịa ije obodo mepere emepe. Nke ọzọ ọ ga-apụịrịrị, ma ọ burụ na o jechaa na nnukwu ụlọ akwụkwọ. Mgbe ọ gụchara ebe ahụ, ọ gaghị eju ya afọ ịnọ n’obodo anyị enweghị ihe e ji ya kpọrọ. Otu o sila dị, ọ gbalisiri ike ịrịọ ha na ọ bụrụ na ha ziga Eze n’ụlọ akwụkwọ dị n’Ọnịcha, na ha ga-eme ya nwoke mbụ si gburugburu Ama jere kọleeji. O kwukwara n’ụzọ aghụghọ sị ama m na ọ gaghị amasị unu ịnụ na onye mbụ jere kọleji na gburugburu ebe a bụ nwaanyị, bụ Chinwe. Ọ ga- amasị unụ? Unu ma na ọ ga-aga, n’ihi na ndị mụrụ ya nwere ego.\nNke a rere ka ọgwụ a gwọrọ agwọ. Ma mgbe a gwara kọmitii ego ole ọ ga-eri ha, ha kwenyere inye ya agụmaakwụkwọ n’efu.\nHa dere leta pụrụ iche, ma ọ bụ na Wilbafọọs depụtara, nke dị otu a. Ndị Kọmiti ndị Ọhịa na-ahụ maka agụmaakwụkwọ n’efu kpebiri na ị bụ nwata nwoke na-agba mbọ ma mara akwụkwọ, onye nwere ike iwetara anyị ugwu na nsopụrụ. Anyị n’otu aka ahụ na-echetakwa ọrụ nna gị rụụrụ anyị n’ịtụnye ndụ ya igbu agụ okpu bịara imemina anyị wee mee ka anyị niile dị ndụ. Anyị ekpebiela iziga gị kọleeji na-enweghị ihe ọ bụla ị ga-akwụ, na-enweghịkwa ihe ọ bụla nne gị ga-akwụ karịa ihe ọ na-atụnye n’ụtụ akpa ego Agụmaakwụkwọ efu a. Atumatụ a hidoro isi n’otu ihe, ị gaghị anọkata n’ule ọ bụla gbadaruo, onye nke iri na klaasị gị.\nA kpọrọ Eze ọ bịa, a gụọro ya akwụkwọ a. Wilbafoos gwara ya okwu sị, nke a pụtara na ị ga-agụsi akwụkwọ ike karịa ka ị na-agụbu n’ihi na ụmụ nwoke ndị dị nkọ sikwa n’ebe ndị ọzọ ga-anọ ebe ahụ bụ ndị gị na ha ga-asọ mpi. Ndị na-elekọta ụlọ akwụkwọ sịrị na ị ga-elele ule n’Ọnịcha nke iji chọpụta ma ahụ gị o zuru oke. Ikedị ga-eje Ọnịcha na mkpụrụ ụbọchị atọ taa, gị na ya ga-esoro gaa ka ị ghara ifu. Mgbe ọ na-aga Ọnịcha, Eze kpọtụrụ Maazị Ọkafọ wee chopụta na ndị na-agbasa Oziọma nyere ya agụmaakwụkwọ n’efu ịga ebe a na- azụ ndị nkuzi n’ihi ihe ọ lụpụtara n’ụlọ akwụkwọ dị n’Ama. Mgbe Eze lechara ule maka ahụ ike ya, o jere hụ onyeisi koleji ahụ bụ ebe adịghị anya site n’ụlọ ọgwu ahụ. E nyere ya akwụkwọ e dere ihe dị iche ọ ga-eji bido akwụkwọ ma dụọ ya ọdụ ka ọ hụ na ọ nọ n’ogige ụlọ akwukwọ ahụ n’oge n’ụbọchị ha ga- ebido akwụkwọ. Mgbe a jụchara ha obere ajujụ Ikedị, onye ya na Eze soro jee Ọnịcha kpọrọ ya gaa n’ọdụ ụgbọ ala, ebe ha ga-eji gwongworo laghachi n’Obodo site ebe ahụ, ha ga-eji ụkwụ si Ama wee rue Ọhịa. Ha kwụrụ ụgwọ ụgbọ ala mana ha apụghị rue ehihie n’ihi na onye na-akwọ ụgbọ ala kwuru na ọ gaghị apụ rue mgbe ụgbọ ala ahụ juru.\nỤgbọ ala a emeela ochie, pentị e tere n’ahụ ya ná-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ akpụchasịala ma chaghaa. Ebe njikọ ya niile na-achọzi ịdapụ adapụ nke bụ na ọ na-aga n’ụzọ, ọ na-eme mkpọtụ akwụsi akwụsị; ụkwụ taya ya niile bụ nke a machigasịrị ihe ebe niile. Ọ na-eyi egwu n’ileanya, mana n’ihu ya, e dere ya “Ije ọma nke mbụ” E ji mkpụrụokwu dị otu ntụaka dee nke a.\nIkedị na Eze weere ọnọdụ ha n’osisi nke e jiri mere oche, ma gbakụta onye na-anya ụgbọ ala azụ, ụkwụ ha chịkọrọ n’elu akpati na akpa ihe dị iche iche e bu eje ire n’ahịa Obodo. Nkea mere ka ikpere ha na-emetụ ha n’agba.\nN’ikpe azụ ụgbọ ala ahụ nupuru gawa n’ụzọ e si eje Obodo. Ụgbọ ala ahụ na-agba ọsọ obere na mbụ rue mgbe ọ gafechara obodo ndị ahụ mepere emepe. Mgbe onye na-anya ụgbọ ala ahụ gafechara ebe ikpeazụ ndị uweojii na- anọ, ọ zọdoro ụkwụ aka nri n’ihe na-enye ụgbọ ala ọkụ, nye ya ọkụ nke mere ka ụgbọ ala ahụ gbasiwe ọsọ ike. Ọsọ ahụ na-aka njọ Dị ka taya ya na-agbagharị, ma gwongworo ahụ jufere oke sì n’otu akụkụ kụtụkọrọ gaa n’akụkụ ọzọ Dị ka onye na-anya ya ji otu aka jide ihe na-ebugharị ụgbọ ala, ebe ya na ndị o bu n’azụ na-akparịta ụka. O teghị aka ha malite ịgba ihe ha ka maịlụ iri isii n’otu awa.\nOkporo ụzọ ahụ akwụghị ọtọ mana nkea abụghị nsogbụ nye onye na- akwọ ụgbọ ala ahụ. Ọ dị ya ngwa ije laghachịkwa Ọnịcha ka o wee nwee ike jeghachi Obodo ọzọ tupu chi ejie. Nke ọzọ ụbọchị ahụ bụ Satọdee, ọ chọghị ka o gbuo oge maka ịga n’ebe ha na-anụ mmanya nke a na-eje n’izu ọ bụla.\nO wee kpọtụọ, O mere na ntụmadị nke na onye na-anya ụgbọ ala ahụghị ihe na-achọ ime. Otu ehi gbapụtara n’ụzọ, ma Dị ka ọ na-achọ ka o zere ya, o jiri breeki n’ike mana ụgbọ ala ahụ nọ n’oke ọsọ nke mere na ọ kwụsịghị ozigbo, ụgbọ ala ahụ ji ike gaa suo otu nnukwu osisi, n’ihi ya, ọ malitere tụgharịba nke na o ji akụkụ ya wee guzoro. Mana tupu nke a na-eme onye na- anya ya amapụla.\nỤgbọ ala ọzọ na-abịa n’azụ ha kwụsịrị, ndị o bu rituru wee nye aka si n’Ije ọma nke mbụ ọbara tetọsịrị, kurisiri, na-ebupụta ndị amaghị onwe ha. O teghị aka ụgbọ ala ndị ọzọ bịara kwụsị nyekwa aka n’ọrụ nnapụta a. Mmadụ atọ ka o gburu. Ọkara n’ime ndị ụgbọ ala ahụ bu amaghị onwe ha nke na e buuru ha gbagaa ụlọ ọgwụ dị n’Ọnịcha.\nEze onye iru ya niile bụ sọ ọnya so na ndị amaghị onwe ha. Ọbara si n’ọnụ ya atụpụta ma i lee ya anya na mbụ ọ dị ka o merụrụ nnukwu ahụ n’ime. Mana mgbe dọkịta lelesịrị ya, ọ chọpụtara na ọ bụ naanị aka ka ọ gbajiri. O were ụbọchị abụọ tupu ọ marakwa onwe ya.\nMaazị Ọkafọ gbagara Ọnịcha ozigbo ọ nụrụ maka ihe mberede okporo ụzọ ahụ dị egwu. Ihe mbụ o chere bụ na ‘Eze agaghị agakwa akwụkwọ n’oge, na ọ ga-echere rue afọ ọzọ tupu ọ malite. Otu echiche a bịakwara Eze n’obi ozigbo o nwere ike ikwu okwu, o jụrụ dọkịta ma o nwere ike ije akwụkwọ n’oge. Na mbụ dọkịta achọghị inye ya ụsa ọ bụla, ọ bụ ezie na ọ na-eche na Eze ga-adị mma mgbe adịghị anya mana ọ chọghị ikwu otu ahụ n’ihi na ọ maghị ma o nwere ihe nwere ike ịdapụta.\nMa mgbe Maazị Ọkafọ kpọpụrụ dọkịta ahụ n’akụkụ jụọ ya ma Eze ọ ga- adịkwa mma ije akwụkwọ n’izu ụka atọ na-abịa, dọkịnta ahụ mere nnọọ ka o doo anya na ọ ga-adịcha mma. Mgbe Maazị Ọkafọ gwara Eze na ya amaghị ma ọ ga-enwe ike ibido akwụkwọ, Eze sitere n’ọchị Maazị Ọkafọ na-achị chọpụta nke bụ eziokwu. Ọ maara mgbe ahụ na ya ga-eje akwụkwọ na-agbanyeghị ihe niile merenụ." ] }